Categories
LUK

LUK 8

1 O we rue mb͕e nwa oge gasiri, na Ya onwe-ya nāgaghari n’obodo na obodo ntà di iche iche, nēkwusa nēzikwa ozi ọma ala-eze Chineke, Ya na ndi-ozi iri na abua ahu,

2 na ndinyom ufọdu ndi emereri ka aru-ha di ike site n’ichupu ndi-mọ ọjọ na igwọ nriaria, Meri nke akpọrọ Magdalini, onye mọ ọjọ asa siwori nime ya puta,

3 na Joana nwunye Kuza onye Herod tiyere ihe-ya n’aka, na Susana, na ọtutu ndi ọzọ, ndi nēweputa ihe ha nwere ime ezi ha.

4 Ma mb͕e oké ìgwè madu nēzukọ, mb͕e ndi si n’obodo nile nābiakute kwa Ya, O we kwue okwu site n’ilu:

5 Ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru-ya: mb͕e ọ nāgha, ufọdu we da n’akuku uzọ; ewe zọkwasi ha ukwu, anu-ufe nke elu-igwe we tuturie ha.

6 Nkpuru ọzọ we da n’elu oké nkume; mb͕e ha puru ome, ha we kpọnwua, n’ihi na ha enweghi ala miri.

7 Nkpuru ọzọ we da n’etiti ogwu; ogwu ahu we so ha pue, kpab͕ue ha.

8 Nkpuru ọzọ we da n’ezi ala, ha we pue, we mia nkpuru ọgu ise ọgu ise. Mb͕e O nēkwu okwu ndia, O tie nkpu, si, Onye nwere nti inu ihe, ya nu.

9 Ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya ihe ilu a gābu.

10 O we si, Ọ bu unu ka enyeworo imara ihe-omimi ala-eze Chineke: ma ndi fọduru ka anāgwa okwu n’ilu; ka ha ghara ihu n’ọhuhu, ghara kwa inuta n’ọnunu.

11 Ma ilu ahu bu nka: Nkpuru ahu bu okwu Chineke.

12 Ndi nọ n’akuku uzọ ahu bu ndi nuru; mb͕e ahu ekwensu bia, we napu okwu ahu n’obi-ha, ka ha ghara ikwere, ewe zọputa ha.

13 Ndi nọ kwa n’oké nkume ahu bu ndi were ọṅù nara okwu ahu mb͕e ọ bula ha nuru ya; ma ndia enweghi nkpọrọgwu, ndi kwere na nwa oge, ma n’oge ọnwunwa ha wezuga onwe-ha.

14 Nkpuru nke dara n’etiti ogwu ahu, ndia bu ndi nuru, ma mb͕e ha nāga n’uzọ-ha ncheb͕u na àkù na ihe-utọ nke ndu anākpab͕u ha, ha amighi ezi nkpuru.

15 Nkpuru nke di n’ala ọma ahu, ndia bu ndi were ezi obi di nma jisie okwu ahu ike, mb͕e ha nuru ya, ha were kwa ntachi-obi mia nkpuru.

16 Ma ọ dighi onye ọ bula, mb͕e ọ muyere oriọna, nēkpuchi ya n’ihe, ma-ọbu dọba ya n’okpuru ihe-ndina; kama ọ nādọba ya n’elu ihe-idọba-oriọna, ka ndi nke nābà nime we hu ìhè-ya.

17 N’ihi na ọ dighi ihe ezoro ezo, nke anāgaghi-eme ka ọ puta ìhè; ọ dighi kwa ihe di nzuzo, nke anāgaghi-ama, me kwa ka ọ puta ìhè.

18 Ya mere, lezienu anya otú unu si anu: n’ihi na onye ọ bula nke nwere, onye ahu ka agēnye; onye ọ bula nēnweghi kwa, ọbuná ihe ọ nēchè na o nwere ka agānapu ya.

19 Ma nne-Ya na umu-nne-Ya biakutere Ya, ma ha apughi ibiaru Ya nso n’ihi ìgwè madu ahu.

20 Ewe si Ya, Nne-gi na umu-nne-gi nēguzo n’èzí, nāchọ ihu Gi anya.

21 Ma Ọ zara, si ha, Nnem na umu-nnem bu ndia ndi nānu okwu Chineke, nēme kwa ya.

22 O rue n’otù nime ubọchi ahu, na Ọ batara n’ub͕ọ, Ya onwe-ya na ndi nēso uzọ-Ya; O we si ha, Ka ayi gabiga n’ofè ọdọ-miri a ọzọ: ha we nupu.

23 Ma mb͕e ha nēje Ọ da n’ura: oké ajọ ifufe we da n’ọdọ-miri ahu; miri nēju kwa n’ub͕ọ-ha, ha we nọdu n’ọnu ọnwu.

24 Ha we biakute Ya, kpọte Ya, si, Nna-ayi, Nna-ayi, ayi nāla n’iyì. O we teta, bara ifufe na ebili-miri mba: ha we da juu, ndaju we di.

25 O we si ha, Òle ebe ka okwukwe-unu di? Ha we tua egwu, o ju ha anya, ha sirita onwe-ha, Ònye bu kwa Onye a, na Ọ nēnye ọbuná ifufe na miri iwu, ha nāṅa kwa Ya nti?

26 Ha we rue ala ndi Gerasa, nke di na ncherita-iru Galili.

27 Ma mb͕e O siri n’ub͕ọ puta rigo n’ala, otù nwoke nke si n’obodo ahu puta zutere ya, bú onye nwere ndi-mọ ọjọ; ma na mb͕e di anya ọ dighi uwe o yiri, o bighi kwa n’ulo, kama n’ebe anēlì ozu.

28 Ma mb͕e ọ huru Jisus, o tisie nkpu ike, da kwa n’ala n’iru Ya, were oké olu si, Gini ka mu na Gi nwekọrọ, Jisus, Ọkpara Chineke Nke kachasi ihe nile elu? ariọm Gi, emekpalam aru.

29 N’ihi na O nyere mọ ahu nādighi ọcha iwu ka o si nime nwoke ahu puta. N’ihi na ọtutu mb͕e ka ọ nējisi ya ike: anēche kwa ya nche, ewere kwa nkpọrọ na nkpọrọ-ukwu ke ya; o we nyajipu ihe eji ke ya, mọ ọjọ ahu we churu ya ba n’ọhia.

30 Jisus we jua ya, si, Òle aha-gi? Ọ si, Legion; n’ihi na ọtutu ndi-mọ ọjọ bàra nime ya.

31 Ha we riọ Ya ka ọ ghara inye ha iwu ka ha je ba n’abyss.

32 Ma ìgwè ọtutu ezì di n’ebe ahu nāta nri n’ugwu: ha we riọ Ya ka O kwere ha ka ha ba nime ha. O we kwere ha.

33 Ndi-mọ ọjọ ahu we si nime nwoke ahu puta, ba nime ìgwè ezì ahu: ìgwè ezi ahu we nuda n’ebe ahu di nkputankpu dabà n’ọdọ-miri, miri we b͕ab͕ue ha.

34 Ma mb͕e ndi nāzù ha huru ihe emereri, ha b͕alaga, kọsa ya n’obodo ahu na gburugburu ya nile.

35 Ha we pua ihu ihe emereri; ha we biakute Jisus, we hu nwoke ahu, nke ndi-mọ ọjọ siri nime ya puta, ka ọ nọduru ala n’ukwu Jisus, yiri uwe, uche-ya zu-kwa-ra okè: ha we tua egwu.

36 Ndi huru ya we kọrọ ha otú azọputara onye ahu ndi-mọ ọjọ ji.

37 Ọra nile nke ala ndi Gerasa di ya gburugburu we kpere Ya ka O si n’ebe ha nọ la; n’ihi na ha nātu oké egwu: O we ba nime ub͕ọ, laghachi.

38 Ma nwoke nke ndi-mọ ọjọ siri nime ya puta nāriọ Ya ka ya na Ya biri: ma O zilagara ya, si,

39 Laghachi n’ulo-gi, kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke meworo gi. O we je, nēkwusa n’obodo ahu dum ihe Jisus mere ya, ka ha ra.

40 Ma mb͕e Jisus laghachiri, ìgwè madu ahu nara Ya nke-ọma; n’ihi na ha nile nēle anya Ya.

41 Ma le, otù nwoke, aha-ya bu Jeairọs, biara, ya onwe-ya bu kwa onye-isi ulo-nzukọ: o we da n’ala n’ukwu Jisus, we riọ Ya ka Ọ bia n’ulo-ya;

42 n’ihi na o nwere nwa-nwanyi ọ muru nání ya, nke b͕ara ihe ra ka arọ iri na abua, nwata ahu nānwu kwa anwu. Ma mb͕e Ọ nēje ìgwè madu nile nākpab͕u Ya.

43 Otù nwanyi nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua, nke mefusiri ihe dum o ji biri n’aru ndi-dibia, ma ọ dighi onye ọ bula nwere ike ime ka aru-ya di ike,

44 nwanyi ahu we bia n’azu Ya, we metu ọnu-ọnu uwe-Ya aka: ngwa ngwa orùrù-ọbara-ya we guzo.

45 Jisus we si, Ònye bu onye ahu nke meturum aka? Ma mb͕e madu nile di nāgo, Pita na ndi ya na ha yikọ si, Nna-ayi, ìgwè madu ndia nādagide Gi nākpab͕u kwa Gi.

46 Ma Jisus siri, Madu meturum aka: n’ihi na Mu onwem mara na ike esiwori n’arum puta.

47 Ma mb͕e nwanyi ahu huru na o zoghi ezo, o were ima-aru-jijiji bia, we da n’iru Ya, kọ n’iru ndi-Ju ahu nile ihe mere o ji metu Ya aka, na otú esi me ka aru di ya ike ngwa ngwa.

48 Ma Ọ siri ya, Nwam nwanyi, okwukwe-gi azọputawo gi; la n’udo.

49 Mb͕e Ọ kpu okwu n’ọnu, otù onye si n’ulo onye-isi ulo-nzukọ ahu bia, si, Nwa-gi nwayi anwuruwo; esob͕u-kwa-la Onye-ozizí a ọzọ.

50 Ma mb͕e Jisus nuru ya, Ọ za ya, si, Atula egwu: kwere nání, agāzọputa kwa ya.

51 Ma mb͕e Ọ biaruru ulo ahu, O kweghi onye ọ bula so Ya ba, ma-ọbughi Pita, na Jọn, na Jemes, na nna nwata-nwayi ahu na nne-ya.

52 Ma madu nile nākwa ákwá, nēti kwa aka n’obi n’ihi ya: ma Ọ siri, Unu akwala ákwá; n’ihi na ọ nwughi anwu, kama ọ nāraru ura.

53 Ha we chìa Ya ọchì, ebe ha matara na ọ nwuru anwu.

54 Ma Ya onwe-ya jidere ya n’aka, we kpọ, si, Nwata-nwanyi, bilie.

55 Mọ-ya we lata, o wè bilie ngwa ngwa: O we si ka enye ya ihe-oriri.

56 Ibobo we nwubiga ndi muru ya ókè n’aru: ma O nyere ha iwu ka ha ghara igwa onye ọ bula ihe emereri.

Categories
LUK

LUK 9

1 O we kpọkọta ndi-ozi iri na abua ahu, nye ha ike na ichi-isi n’ebe ndi-mọ ọjọ nile nọ, na igwọ ọria di iche iche.

2 O we zipu ha ikwusa ala-eze Chineke, na ime ka aru di ndi-nriaria ike.

3 O we si ha, Unu ewela ihe ọ bula n’ije-unu, unu ewela nkpa-n’aka, ma-ọbu àkpà, ma-ọbu ob͕e achicha, ma-ọbu ego; unu enwe-kwa-la uwe-ime abua.

4 Ulo ọ bula unu gābà, nọgidenu n’ebe ahu, si kwa n’ebe ahu pua.

5 Ka ha ra kwa, bú ndi nānaraghi unu nke-ọma, mb͕e unu nāpu n’obodo ahu tichapu ájá di n’ukwu-unu ka ọ buru ha àmà.

6 Ha we pua, we nējezu obodo ntà ahu nile, nēzisa ozi ọma Ya, nēme kwa ka aru madu di ike n’ebe nile.

7 Ma Herod, bú tetrarch, nuru ihe nile emere: o we nēcheb͕u onwe-ya, n’ihi na ufọdu siri, na Jọn esiwori na ndi nwuru anwu bilie;

8 ufọdu si-kwa-ra, na Elaija aputawori ihè; ndi ọzọ si-kwa-ra na otù onye nime ndi-amuma ochie esiwori n’ọnwu bilie ọzọ.

9 Ma Herod siri, Mu onwem bipuru isi Jọn: ma ònye bu Onye a, Nke m’nānu ihe bayere Ya di otú a? O we nāchọ uzọ ihu Ya anya.

10 Mb͕e ndi-ozi Jisus latara, ha we kọrọ Ya ihe nile ha mere, ka ha ra. O we chiri ha tiyere Onwe-ya, wezuga Onwe-ya iche rue obodo anākpọ Betsaida.

11 Ma mb͕e ìgwè madu nile mara ya, ha soro Ya: O we nara ha nke-ọma, we gwa ha okwu bayere ala-eze Chineke, nēme kwa ka aru di ha ike, bú ndi ọ di nkpà ka eme ka aru-ha di ike.

12 Ma chi malitere iji; ndi-ozi iri na abua ahu we biakute Ya, si Ya, Zilaga ìgwè madu a, ka ha we ga n’obodo ntà nile na ubi nile di buruburu, nọ ọnọdu-abali, chọta kwa ihe ha gēri; n’ihi na ayi nọ n’ebe a nime ọhia.

13 Ma Ọ siri ha, Unu onwe-unu nye ha ihe ka ha rie. Ha we si, Ayi enweghi kari ob͕e achicha ise na azù abua; ma-ọbughi na ayi onwe-ayi gāga zuta nri nye ndi nka nile.

14 N’ihi na ha ra ka nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri. O we si ndi nēso uzọ-Ya, Menu ka ha nọdu ala n’òtù di iche iche, ihe dika ọgu madu abua na iri n’otù òtù.

15 Ha we me otú ahu, me ka ha nile nọdu ala.

16 O we nara ob͕e achicha ise na azù abua ahu, le anya n’elu-igwe, gọzie ha, nyawa; O we nēnye ndi nēso uzọ-Ya ka ha debe ha n’iru ìgwè madu ahu.

17 Ha we rie, afọ ju-kwa-ra ha nile: ewe tutukọ iberibe fọduru ha, nkata iri na abua.

18 O rue, mb͕e nání Ya nọ nēkpe ekpere, ndi nēso uzọ-Ya nọyere Ya: O we jua ha, si, Ònye ka ọra madu nāsi na Mu onwem bu?

19 Ha we za, si, Jọn Baptist; ma ndi ọzọ si, Elaija: ma ndi ọzọ si, na otù onye nime ndi-amuma ochie esiwo n’ọnwu bilie ọzọ.

20 O we si ha, Ma ọ̀ bu onye ka unu onwe-unu si na Mu bu? Pita we za, si, Kraist nke Chineke.

21 Ma Ọ dọrọ ha aka na nti, nye kwa ha iwu ka ha ghara igwa onye ọ bula ihe a;

22 si, Nwa nke madu aghaghi ihu ọtutu ahuhu, ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ aghaghi kwa iju Ya, aghaghi ib͕u kwa Ya, na ime kwa ka O si n’ọnwu bilie n’ubọchi nke-atọ.

23 O we si ha nile, Ọ buru na onye ọ bula achọ ka o som n’azu, ya ju onwe-ya, buli kwa obe-ya kwa-ubọchi, nēsokwam.

24 N’ihi na onye ọ bula nke nāchọ izọpuita ndu-ya, ọ gētufu ya; ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya n’ihim, onye ahu gāzọputa ya.

25 N’ihi na ùrù gini ka ọ nābara madu, ma ọ buru na o rita uwa dum n’urù, o we tufue ma-ọbu anapu ya onwe-ya?

26 N’ihi na onye ọ bula ihere Mu onwem na okwum nile gēme, ihere onye ahu gēme Nwa nke madu, mb͕e Ọ gābia n’ebube nke aka Ya, na ebube nke Nna-Ya, na ebube nke ndi-mọ-ozi-Ya di nsọ.

27 Ma asim unu n’ezie, Ufọdu di n’etiti ndi guzoro n’ebe a, ndi nāgaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli, rue mb͕e ha gāhu ala-eze Chineke.

28 O we rue mb͕e ubọchi asatọ gasiri mb͕e O kwusiri okwu ndia, na Ọ chiri Pita na Jọn na Jemes tiyere Onwe-ya, rigo n’ugwu ahu ikpe ekpere.

29 Mb͕e Ọ nēkpe ekpere, oyiyi iru-Ya we di iche, uwe-Ya we nācha ucha nēb͕u kwa dika àmùma.

30 Ma le, Ya na ndikom abua nēkwurita okwu, ndi bu Moses na Elaija;

31 ndi emere ka ahu ha anya n’ebube, ndi nēkwu kwa okwu bayere ọlila-Ya, nke Ọ gaje imezu na Jerusalem.

32 Ma ura jururi Pita na ndi ya na ha nọ n’anya: ma mb͕e ha tetara nke-ọma, ha hu ebube-Ya, na ndikom abua ahu Ya na ha guzoro.

33 O we rue, mb͕e ha si n’ebe Ọ nọ nēkewapu, Pita si Jisus, Nna-ayi, ọ di nma ka ayi nọ n’ebe a: ka ayi ma kwa ulo-ikwū atọ; ka otù diri Gi, ka otù di-kwa-ra Moses, ka otù di-kwa-ra Eliaja: n’ihi na ọ mataghi ihe ọ nēkwu.

34 Mb͕e ọ nēkwu okwu ndia, igwe-oji we bia, kpuchie ha: ha we tua egwu mb͕e ha nābà n’igwe-oji ahu.

35 Olu we si n’igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam, Onye M’rọputara: nurunu okwu-Ya.

36 Mb͕e olu ahu putasiri, ahuru nání Jisus. Ndi ahu we kpuchie ọnu-ha, ha akọghi kwa akukọ ihe ọ bula ha hururi nye onye ọ bula na mb͕e ahu.

37 O rue, n’ubọchi so ya, mb͕e ha siri n’ugwu ahu rida, na oké ìgwè madu zutere Ya.

38 Ma le, otù nwoke si n’ìgwè madu ahu ti nkpu, si, Onye-ozizí, ariọm Gi ka I le nwam nwoke anya; n’ihi na ọ bu nwam m’muru nání ya:

39 le kwa, ajọ mọ nējide ya, o we nēti nkpu na mberede; ajọ mọ ahu nēse kwa ya, me ka ọ nāsu ufufu n’ọnu, o ji kwa ike arapu ya, nēchihia ya aru nke-uku.

40 M’we riọ ndi nēso uzọ-Gi ka ha chupu ya; ma ha apughi.

41 Jisus we za, si, Unu ọb͕ọ nēnweghi okwukwe, nke nwe-kwa-ra anya-ùhìe, rùe ole mb͕e ka Mu na unu gānọ, ewem nagide kwa unu? kuta nwa-gi n’ebe a.

42 Mb͕e ọ nọ nābiakute Ya, mọ ọjọ ahu we tuda ya n’ala, sesie ya ike. Ma Jisus bara mọ ahu nādighi ọcha nba, we me ka aru nwa-okoro ahu di ike, O we kuru ya nyeghachi nna-ya.

43 Ma ibobo idi-uku nke Chineke nwuru ha nile n’aru.

Ma mb͕e ihe nile Ọ nēme nēju madu nile anya, Ọ si ndi nēso uzọ-Ya,

44 Unu onwe-unu debe okwu ndia na nti-unu: n’ihi na agaje irara Nwa nke madu nye n’aka madu.

45 Ma ha aghọtaghi okwu a, ọ bu kwa ihe ezonariwori ha, ka ha ghara inuta ya: ha nātu kwa egwu iju Ya ajuju bayere okwu a.

46 Iru-uka we da n’etiti ha, onye gāka ibe-ya uku n’etiti ha.

47 Ma mb͕e Jisus huru iru-uka nke di n’obi-ha, O jide nwatakiri n’aka, debe ya n’akuku Ya,

48 we si ha, Onye ọ bula nke gānara nwatakiri a nke-ọma n’aham, ọ bu Mu onwem ka ọ nānara nke-ọma: onye ọ bula nke nānara kwa Mu nke-ọma nānara Onye ziputaram nke-ọma: n’ihi na onye dikari ntà n’etiti unu nile, onye ahu bu onye uku.

49 Jọn we za, si, Nna-ayi, ayi huru otù onye ka ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ n’aha-Gi; ayi we b͕ochie ya, n’ihi na ọ dighi-eso ayi.

50 Ma Jisus siri ya, Unu eb͕ochila ya: n’ihi na onye nādighi-emegide unu diri unu.

51 O rue, mb͕e ubọchi nēzu okè mb͕e agānara Ya n’elu, na Ya onwe-ya che iru-Ya si-ike iga Jerusalem,

52 O we zipu ndi-ozi n’iru Ya: ha we ga, ba n’otù obodo ntà nke ndi Sameria, ka ha doziere Ya.

53 Ma ha anaraghi Ya nke-ọma, n’ihi na iru-Ya di ka Ọ nāga Jerusalem.

54 Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya, bú Jemes na Jọn, huru nka, ha si, Onye-nwe-ayi, Ì nāchọ ka ayi si ọku site n’elu-igwe da, rechapu ha?

55 O we chigharia, bara ha nba, si, Unu amataghi aha mọ di nime unu.

56 N’ihi na Nwa nke madu abiaghi ila ndu madu n’iyì, kama ka o we zọputa ha. Ha we pua ga n’obodo ntà ọzọ.

57 Mb͕e ha nāga n’uzọ, otù onye we si Ya, M’gēso Gi ebe ọ bula Ì nēje.

58 Jisus we si ya, Nkita-ọhia nwere ọnu ha nēdina, anu-ufe nke elu-igwe nwe-kwa-ra ebe ha nāraru ura; ma Nwa nke madu enweghi ebe itọb͕ọ isi-Ya.

59 O we si onye ọzọ, Som. Ma ọ siri, Onye-nwe-ayi, kwe ka m’buru uzọ je lìe nnam.

60 Ma Ọ siri ya, Rapu ndi nwuru anwu ka ha lìe ndi nke ha ndi nwuru anwu; ma gi onwe-gi je zisa ozi ala-eze Chineke.

61 Onye ọzọ we si kwa, M’gēso Gi, Onye-nwe-ayi; ma kwe ka m’buru uzọ kele ndi nọ n’ulom ekele ikpe-azu.

62 Ma Jisus siri ya, Ọ dighi onye ọ bula nke nēle anya n’azu, mb͕e o tiyesiri aka-ya n’ọ́gù anu-ulo nādọkpughari, kwesiri ala-eze Chineke.

Categories
LUK

LUK 10

1 Ma mb͕e ihe ndia gasiri Onye-nwe-ayi guputara ọgu ndikom atọ na iri di iche, we zipu ha abua abua ka ha ga n’iru Ya ba n’obodo na ebe ọ bula, ebe Ya onwe-ya gaje ibia.

2 O we si ha, Owuwe-ihe-ubi riri nne n’ezie, ma ndi-ọlu di ole-na-ole: ya mere, nāriọnu Onye-nwe owuwe-ihe-ubi ahu, ka O zipu ndi-ọlu ba n’owuwe-ihe-ubi-Ya.

3 Jenu: le, Mu onwem nēzipu unu dika umu-aturu n’etiti agu.

4 Unu ewela àkpà-ego, ma-ọbu àkpà-ije, ma-ọbu akpukpọ-ukwu: unu ekele-kwa-la onye ọ bula n’uzọ.

5 Ma ulo ọ bula unu gābà nime ya, burunu uzọ si, Udo diri ulo a.

6 Ọ buru kwa na onye-udo nọ n’ebe ahu, udo-unu gānọkwasi ya: ma ọ buru na onye-udo anọghi ya, udo-unu gālaghachiri unu ọzọ.

7 Nọgide-kwa-nu n’ulo ahu, nēri nāṅu kwa ihe ha nēnye umu: n’ihi na onye-ọlu kwesiri ugwọ-ọlu-ya. Unu esila n’otù ulo ba n’ulo ọzọ.

8 Nime obodo ọ bula unu gābà kwa, ha we nara unu nke-ọma, rienu ihe edebere n’iru unu:

9 mekwanu ndi aru-ha nādighi ike nọ n’ebe ahu ka aru-ha di ike, si-kwa-nu ha, Ala-eze Chineke di unu nso.

10 Ma nime obodo ọ bula unu gābà, ma ha anaraghi unu nke-ọma, puanu n’amá-ya, si,

11 Ọbuná ájá si n’obodo-unu, nke rakuru n’ukwu-ayi, ka ayi nēhichapu imegide unu: otú ọ di, maranu nka, na ala-eze Chineke di nso.

12 Asim unu, Ala Sọdọm gānagide okwu n’ubọchi ahu kari obodo ahu.

13 Ahuhu gādiri gi, Korazin; ahuhu gādiri gi, Betsaida; n’ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Taia na Saidon, nke aluru nime unu, ha gēchèghariwori n’oge di anya gara aga, nānọdu n’ákwà-nkpe na ntu.

14 Otú ọ di, Taia na Saidon gānagide okwu n’ikpé ahu kari unu.

15 Gi onwe-gi kwa, Kapanaum, àgēweli gi rue elu-igwe? agēweda gi rue Hedis.

16 Onye nānu okwu-unu nānu okwu Mu onwem; onye nāju kwa unu nāju Mu onwem; ma onye nāju Mu onwem nāju Onye ziterem.

17 Ọgu ndikom atọ na iri ahu were ọṅù lata, si, Onye-nwe-ayi, ọbuná ndi-mọ ọjọ ka anēdo n’okpuru ayi n’aha-Gi.

18 O we si ha, Ahurum Setan ka ọ darari dika àmùmà pua n’elu-igwe.

19 Le, enyewom unu ike izọkwasi agwọ na akpi ukwu, na imegide ike onye-iro-unu nile: ọ dighi kwa ihe ọ bula gēmeru unu aru ma-ọli.

20 Otú ọ di, unu aṅurila ọṅu na nka, na anēdo ndi ajọ mọ n’okpuru unu; ma ṅurianu ọṅu na edewo aha-unu n’akwukwọ n’elu-igwe.

21 N’oge hour ahu tọrọ Ya utọ nke-uku nime Mọ Nsọ, O we si, Ekelem Gi, Nna, Onye-nwe elu-igwe na uwa, na I zonariri ndi-amam-ihe na ndi nwere nghọta ihe ndia, I were kwa ha kpughere umu ọhu: e, Nna; ekelem Gi na ọ di ezi nma otú a n’iru Gi.

22 Nnam rara ihe nile nyem n’aka: ọ dighi kwa onye ọ bula mara Onye Ọkpara ahu bu, ma-ọbughi Nna-Ya; na Onye Nna ahu bu, ma-ọbughi Ọkpara-Ya, na onye ọ bula Ọkpara nēzube ikpughe Ya nye ya.

23 Mb͕e O chigharisiri n’ebe ndi nēso uzọ-Ya nọ, O we si n’iche, Ngọzi nādiri anya nāhu ihe unu nāhu:

24 n’ihi na asim unu, na ọtutu ndi-amuma na ndi-eze chọrọ ihu ihe unu onwe-unu nāhu, ma ha ahughi ha; na inu ihe unu nānu, ma ha anughi ha.

25 Ma le, otù onye-iwu biliri, we nwa Ya, si, Onye-ozizí, ọ̀ bu gini ka m’gēme ka m’we keta ndu ebighi-ebi?

26 O we si ya, Gini ka edeworo n’akwukwọ iwu? ì si aṅa agu ya?

27 O we za, si, Hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n’anya site n’obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, na ike-gi dum, na uche-gi dum; hu kwa onye-ab͕ata-obi-gi n’anya dika onwe-gi.

28 O we si ya, I zara nke-ọma: me nka, i gādi kwa ndu.

29 Ma ebe ọ nāchọ igu onwe-ya n’onye ezi omume, ọ si Jisus, Ònye bu kwa onye-ab͕ata-obim?

30 Jisus zara ya, si, Otù nwoke si na Jerusalem nārida iga Jeriko; o we dabà n’etiti ndi nāpunara madu ihe, ndi b͕ara ya ọtọ ti kwa ya ihe-otiti, we la, rapu ya ọtọgbọrọ.

31 Ma n’otù mb͕e ahu otù onye-nchu-àjà nārida n’uzọ ahu: mb͕e ọ huru ya, o we si n’akuku uzọ ọzọ gabiga.

32 Otú ahu onye Livai, mbe ọ biaruru ebe ahu, hu kwa ya, o we si kwa n’akuku uzọ ọzọ gabiga.

33 Ma otù onye Sameria, mb͕e ọ nọ n’ije, ọ bia rue n’ebe ọ nọ: mb͕e ọ huru ya, o we nwe ọmiko n’aru ya,

34 o we biakute ya, ke ọnyá nile ya, wukwasi ha manu na manya-vine; o we tukwasi ya n’anu-ulo nke aka ya, dubata ya n’ulo ndi-ọbìa, we le ya anya nke-ọma.

35 N’echi-ya o we tuputa shilling abua, nye onye-nwe ulo ndi-ọbìa ahu, si, Le ya anya nke-ọma; ihe ọ bula i n’akuku uzọ kari, mu onwem, mb͕e m’latara, m’gākwughachi gi.

36 Ọ̀ bu onye nime madu atọ a, ka i chère, gosiri onwe-ya ka onye-ab͕ata-obi nke onye ahu dabàra n’etiti ndi ahu nāpunara madu ihe?

37 Ọ si, Onye ahu nke mere ya ebere. Jisus we si ya, Ga, gi onwe-gi me kwa otú ahu.

38 Ma mb͕e ha nāga, Ya onwe-ya batara n’otù obodo ntà: otù nwanyi, aha-ya bu Mata, we kpọbata Ya n’ulo-ya.

39 O nwekwara nwa-nne-nwanyi anākpọ Meri, onye nānọdu kwa ala n’ukwu ala Onye-nwe-ayi, we nu okwu-Ya.

40 Ma uche Mata nābasasi n’ije-ozi nke-uku; o we biakute Ya ọsọsọ, si, Onye-nwe-ayi, ò metughi Gi n’obi na nwa-nnem nwanyi nārapum ka nání mu nēje ozi? ya mere, gwa ya ka o yerem aka.

41 Ma Onye-nwe-ayi zara, si ya, Mata, Mata, i nēcheb͕u onwe-gi nēsob͕u kwa onwe-gi n’ihi ọtutu ihe:

42 ma otu ihe bu ihe di nkpà: n’ihi na Meri rọputara ezi òkè ahu, nke anāgaghi-anapu ya.

Categories
LUK

LUK 11

1 O rue, mb͕e Ọ nēkpe ekpere n’otù ebe, mb͕e O kpebìri, na otù onye nime ndi nēso uzọ-Ya si Ya, Onye-nwe-ayi, zí ayi ikpe ekpere, dika Jọn zikwara ndi nēso uzọ-ya.

2 O we si ha, Mb͕e ọ bula unu nēkpe ekpere, sinu, Nna, Ka edo aha-Gi nsọ. Ka ala-eze-Gi bia.

3 Nēnye ayi nri kwa-ubọchi nke gēzuru ayi n’ubọchi ta.

4 B͕aghara kwa ayi nmehie nile ayi; n’ihi na ayi onwe-ayi nāb͕aghara kwa onye ọ bula nke ji ayi ugwọ. Ewebà-kwa-la ayi nime ọnwunwa.

5 O we si ha, Ònye nime unu gēnwe eyì, gējeku kwa ya n’etiti abali, si ya, Eyìm, binyem ob͕e achicha atọ;

6 n’ihi na otù eyìm esiwo n’ije biakutem, ma enweghm ihe ọ bula m’gēdebe n’iru ya;

7 ma onye ahu gēsi nime ulo za, si, Esob͕ulam: emechiwo uzọ ub͕u a, mu na umu-ntakirim nēdina kwa n’ihe-ndina-ayi; apughm ibili inye gi?

8 Asim unu, Ọ buru kwa na ọ gaghi-ebili inye ya n’ihi na ọ bu eyì-ya, ma n’ihi aririọ-ya nēnweghi ihere ọ gēbili nye ya ka ihe di ya nkpà ra.

9 Mu onwem si kwa unu, Riọnu, agēnye kwa unu, chọnu, unu gāchọta kwa; kuanu, agēmeghe-kwa-ra unu.

10 N’ihi na onye ọ bula nke nāriọ nāriọta; onye nāchọ kwa nāchọta; onye nāku kwa ka agēmeghere.

11 Ma ònye n’etiti unu, bú nna, ka nwa-ya gāriọ ob͕e achicha, ọ nye ya nkume? ma-ọbu azù, ọ nye ya agwọ n’ọnọdu azù?

12 Ma-ọbu asi na ọ gāriọ àkwá ọkuku, ọ̀ gēnye ya akpi?

13 Ya mere, ọ buru na unu onwe-unu, ọ bu ezie na unu jọrọ njọ, ma unu nāmata inye umu-unu ezi onyinye, Nnà-unu nke elu-igwe gēsi aṅa ghara iwere kari Mọ Nsọ nke-uku nye ndi nāriọ Ya?

14 Ọ nāchupu kwa mọ ọjọ nke dara ob͕i. O we rue, mb͕e mọ ọjọ ahu putasiri, na onye-ob͕i ahu kwuru okwu; O we ju ìgwè madu nile anya.

15 Ma ufọdu nime ha siri, N’ike Beelzebul onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ.

16 Ndi ọzọ nāchọ ihe-iriba-ama n’aka-Ya site n’elu-igwe, n’ihi na ha nānwa Ya.

17 Ma ebe Ya onwe-ya matara èchìchè-uche nile ha, Ọ si ha, Ala-eze ọ̀ bula nke kewara megide onwe-ya, anēme ya ka ọ tọb͕ọrọ n’efu; ulo nke kewakwara megide ulo nāda.

18 Ma ọ buru kwa na Setan kewara megide onwe-ya, àla-eze-ya gēsi aṅa guzo? n’ihi na unu nāsi na anamachupu ndi-mọ ọjọ n’ike Beelzebul.

19 Ma ọ buru na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n’ike Beelzebul, n’ike onye ka umu-unu ndikom nāchupu ha? n’ihi nka ha gābu ndi-ikpé-unu.

20 Ma ọ buru na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n’ike nkpisi-aka Chineke, ya mere ala-eze Chineke ruru unu aru.

21 Mb͕e ọ bula onye di ike nke kezuru ihe-agha-ya nēche obí nke aka ya, ihe o nwere adi n’udo:

22 ma mb͕e ọ bula onye ka ya ike gābia imegide ya, meri kwa ya, ọ nara ya ihe-agha-ya dum nke ọ tukwasiriri obi-ya, keri kwa ihe ọ nara ya.

23 Onye nādighi n’akukum nēmegidem; onye nādighi-esokwam ikpokọta ihe nāchusa achusa.

24 Mb͕e ọ bula mọ nādighi ọcha siri n’aru madu pua, ọ nāgabiga n’ebe miri nādighi nāchọ izu-ike: ma ebe ọ dighi-achọta ya, ọ si, M’gālaghachi n’ulom ebe m’siri puta.

25 Mb͕e ọ biara, o we hu ya ka azachasiri ya dozisia ya.

26 Mb͕e ahu ọ ga, chiri mọ-ibe-ya asa nke jọkari ya onwe-ya njọ tiyere onwe-ya; ha we ba biri n’ebe ahu: ọnọdu ikpe-azu nke madu ahu bia jọkari nke-mbu.

27 O we rue, mb͕e Ọ nēkwu okwu ndia, na otù nwanyi si n’etiti ìgwè madu ahu weli olu-ya, si Ya, Ngọzi nādiri afọ nke buru Gi, na ara nke I miri.

28 Ma Ya onwe-ya siri, Nke bu ezi-okwu kari bu, ngọzi nādiri ndi nuru okwu Chineke, debe kwa ya.

29 Ma mb͕e ìgwè madu nēzukọ n’ebe Ọ nọ, Ọ malitere isi, Ọb͕ọ a bu ajọ ọb͕ọ: ọ nāchọ ihe-iriba-ama; agaghi-enye kwa ya ihe-iriba-ama ma-ọbughi ihe-iriba-ama nke Jona.

30 N’ihi na dika Jona ghọrọ ndi Nineve ihe-iriba-ama, otú a ka Nwa nke madu gādi-kwa-ra ọb͕ọ a.

31 Agēme ka eze-nwanyi nke Ndida so ndikom nke ọb͕ọ a bilie n’ikpé ahu, ọ gāma kwa ha ikpé: n’ihi na o siri n’ebe uwa sọturu bia inu amam-ihe Solomom; ma le, Onye ka Solomom nọ n’ebe a.

32 Ndikom Nineve gēso ọb͕ọ a bilie n’ikpé ahu, ha gāma kwa ya ikpé: n’ihi na ha chèghariri na nkwusa nke Jona; ma le, Onye ka Jona nọ n’ebe a.

33 Ọ dighi onye ọ bula, mb͕e ọ muyere oriọna, nādọba ya n’ebe di nzuzo, ma-ọbu n’okpuru mb͕é, kama n’elu ihe-idọba-oriọna, ka ndi nābà nime ulo we hu ìhè-ya.

34 Oriọna nke aru-gi bu anya-gi: mb͕e ọ bula anya-gi nēle otù ebe, aru-gi dum juputa-kwa-ra n’ìhè; ma mb͕e ọ bula ọ jọrọ njọ, aru-gi juputa-kwa-ra n’ọchichiri.

35 Ya mere, le anya ma ihè di nime gi abughi ọchichiri.

36 Ya mere, ọ buru na aru-gi dum ejuputa n’ìhè, ghara inwe akuku ọ bula b͕ara ọchichiri, aru ahu dum gējuputa n’ìhè, dika mb͕e oriọna, site n’ìhè-ya nēnwu, nēnye gi ìhè.

37 Ma mb͕e Ọ nēkwu okwu, onye-Farisi kpọrọ Ya ka O so ya rie nri-ututu: O we ba, nọdu na nri.

38 Ma mb͕e onye-Farisi ahu huru ihe Ọ nēme, o ju ya anya na O bughi uzọ kwo aka-Ya mb͕e Ọ gaje iri nri-ututu.

39 Ma Onye-nwe-ayi siri ya, Ub͕u a ka unu onwe-unu, bú ndi-Farisi, nēme ka azú iko na afere di ọcha; ma ime-unu juputara n’ipunara-madu-ihe na ajọ ihe.

40 Unu ndi nēnweghi uche, Onye ahu Nke mere azú iko, ọ̀ bughi Ya me-kwa-ra ime-ya?

41 Otú ọ di, werenu ihe di nime lua ọlu ebere; ihe nile di kwa ọcha n’ebe unu nọ.

42 Ma ahuhu gādiri unu ndi-Farisi; n’ihi na unu nēnye otù uzọ n’uzọ iri nke nkpa-akwukwọ nēsi ísì utọ na rue na nkpa-akwukwọ nile, ma unu nagabiga ikpé na ihu-n’anya Chineke: ma ọ di nkpà ka unu me ihe ndia, ka unu ghara kwa irapu ihe ahu.

43 Ahuhu gādiri unu ndi-Farisi; n’ihi na unu nāhu isi oche nile n’ulo-nzukọ nile, na ekele n’ọma-ahia nile, n’anya.

44 Ahuhu gādiri unu; n’ihi na unu di ka ílì nke nāputaghi ìhè, nke madu ndi nējeghari n’elu ha nāmataghi ya.

45 Ma otù onye nime ndi-iwu zara, si Ya, Onye-ozizí, n’ikwu okwu a I nēme kwa ayi ihe-ihere.

46 O we si, Ahuhu gādi-kwa-ra unu ndi-iwu; n’ihi na unu nēbo madu ibu di ike obubu, ma unu onwe-unu ejighi otù nime nkpisi-aka-unu kpatu ibu ahu.

47 Ahuhu gādiri unu; n’ihi na unu nēwu ebe anēlì ndi-amuma, ma nna-unu-hà b͕uru ha.

48 Ya mere unu bu ndi-àmà, ọlu nna-unu-hà di kwa unu ezi nma: n’ihi na ha onwe-ha b͕uru ha, ma unu onwe-unu nēwu ebe anēlì ha.

49 N’ihi nka amam-ihe Chineke kwu-kwa-ra, si, M’gēzigara ha ndi-amuma na ndi-ozi; ufọdu nime ha ka ha gēb͕u kwa sob͕u kwa;

50 ka ewe chọputa ọbara ndi-amuma nile, nke awusiworo site na ntọ-ala uwa, n’aka ọb͕ọ a;

51 site n’ọbara Ebel rue ọbara Zakaraia, onye lara n’iyì n’ab͕ata ebe-ichu-àjà na ulo nsọ unu: e, asim unu, agāchọputa ya n’aka ọb͕ọ a.

52 Ahuhu gādiri unu ndi-iwu; n’ihi na unu wepuru nkpisi-ugodi nke ọmuma-ihe: unu onwe-unu abataghi, unu b͕ochi-kwa-ra ndi nābata.

53 Mb͕e O siri n’ebe ahu puta, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi we malite inọgide Ya si-ike, na ikpasu Ya ikwu okwu bayere ọtutu ihe;

54 nēche Yá anwu, inwude ihe nke gēsi n’ọnu-Ya puta.

Categories
LUK

LUK 12

1 N’oge ahu, mb͕e oké ọtutu ìgwè madu anādighi-aguta aguta zukọrọ, nke mere ka ha nāzọkwasi ibe-ha ukwu, O buru uzọ malite isi ndi nēso uzọ-Ya, Nēzenu ihe ndi-Farisi, bú ihe nēko achicha, nke bu iru-abua.

2 Ma ọ dighi ihe ọ bula ekpuchiworo ekpuchi, nke anāgaghi-ekpughe: ọ dighi kwa ihe ezoro ezo, nke anāgaghi-ama.

3 Ya mere ihe ọ bula unu kwuru n’ọchichiri, agānu ya n’ìhè; ihe unu kwu kwa-ra na nti n’ime-ulo ntà, agēkwusa ya n’elu ulo.

4 Ma asim unu ndi-eyim, Unu atula egwu ndi nēb͕u aru, ma emesia ha enweghi ihe ọzọ kari nke ahu ha gēme.

5 Ma M’gēgosi unu Onye unu gātu egwu: tuanu egwu Onye ahu, Nke nwere ike itubà n’ọku ala-mọ mb͕e O b͕usiri; e, asim unu, Tuanu egwu Onye ahu.

6 Àdighi-ere egwele ise na penny abua? ma adighi-echezọ otù nime ha n’iru Chineke.

7 Ma ọbuná agiri-isi nile nke isi-unu ka aguworo. Unu atula egwu: ọnu-ahia-unu kariri nke ọtutu egwele.

8 Ma asim unu, Onye ọ bula nke gēkwuputam n’iru madu, ya ka Nwa nke madu gēkwuputa kwa n’iru ndi-mọ-ozi nke Chineke:

9 ma onye gāgọnarim n’iru madu, agāgọnari ya n’iru ndi-mọ-ozi nke Chineke.

10 Ọzọ, onye ọ bula nke gēkwu okwu megide Nwa nke madu, agāb͕aghara ya: ma agaghi-ab͕aghara onye gēkwulu Mọ Nsọ.

11 Ma mb͕e ọ bula ha kpọrọ unu bia n’iru ulo-nzukọ, na ndi-isi, na ndi nāchi isi, unu echeb͕ula onwe-unu otú unu gāgọpu onwe-unu ma-ọbu ihe unu gēji gọpu onwe-unu, ma-ọbu ihe unu gēkwu:

12 n’ihi na Mọ Nsọ gēzí unu n’oge hour ahu ihe unu nāghaghi ikwu.

13 Ma otù onye sitere n’igwè madu ahu si Ya, Onye-ozizí, gwa nwa-nnem nwoke ka o kère ihe-nketa-ayi nyem.

14 Ma Ọ siri Ya, Nwoke, ònye merem ka M’buru onye-ikpé ma-ọbu onye-òkìkè n’ebe unu nọ?

15 O we si ha, Lezienu anya, debe-kwa-nu onwe-unu ka unu ghara inwe anya-uku ọ bula: n’ihi na ọ bughi n’ihe ọ nwebigara ókè ka ndu madu di, o sighi n’ihe o nwere puta.

16 O we turu ha ilu, si, Ala otù ọgaranya miri nkpuru ri nne:

17 o we tugharia n’obi-ya, si, Gini ka m’gēme, n’ihi na enweghm ebe ikpokọta nkpurum?

18 O we si, Nka ka m’gēme: m’gēweda ọbam, wu kwa nke ka uku; n’ebe ahu ka m’gēkpokọta ọkam nile na ezi ihem nile.

19 M’gāsi kwa nkpuru-obim, Nkpuru-obi, i nwere ọtutu ezi ihe edebere nye gi rue ọtutu arọ; nēzu ike, nēri ihe, nāṅu ihe-ọṅuṅu, ka obi nātọ gi utọ.

20 Ma Chineke siri ya, Onye nēnweghi uche, n’abali a ka anāchọ mkpure-obi-gi n’aka-gi; ma ihe i doziri, ònye gēnwe ha?

21 Otú a ka ọ di, bú onye nākpadoro onwe-ya àkù, ma ọ bughi ọgaranya n’ebe Chineke nọ.

22 Ọ we si ndi nēso uzọ-Ya, N’ihi nka ka M’ji si unu, Unu echeb͕ula onwe-unu nye ndu-unu, ihe unu gēri; echeb͕u-kwa-la onwe-unu nye aru-unu, ihe unu gēyi.

23 N’ihi na ndu kariri ihe eji azù ya, aru kari-kwa-ra uwe-oyiyi-ya.

24 Tugharinu uche n’ugolo-ọma, na ha adighi-agha nkpuru, ha adighi-ewe kwa ihe ubi; nke nēnweghi ime-ulo ntà ma-ọbu ọba; ma Chineke nāzù ha: ùnu onwe-unu abughi ihe oké ọnu-ahia kari anu-ufe nke-uku?

25 Ma ònye n’etiti unu puru itukwasi otù cubit n’ogologo-ya site n’icheb͕u onwe-ya?

26 Ya mere ọ buru na unu apughi ime ọbuná nke dikarisiri ntà, gini mere unu nēcheb͕u onwe-unu n’ihe fọduru?

27 Tugharinu uche n’ahihia nke ọhia, otú ha nētó etó: ha adọb͕ughi onwe-ha n’ọlu, ha atughi kwa ogho; ma asim unu, Ọbuná Solomom n’ebube-ya nile, eb͕okwasighi ya ákwà dika otù nime ndia.

28 Ma ọ buru na Chineke eyikwasi ahihia di n’ubi uwe otú a, nke di ta, echi atubà ya n’ite ọku; Ọ̀ gaghi-eyikwasi kari unu uwe nke-uku, unu ndi okwukwe ntà?

29 Unu onwe-unu achọ-kwa-la ihe unu gēri, na ihe unu gāṅu, unu enwe-kwa-la obi abua.

30 N’ihi na ihe ndia nile ka mba nile nke uwa nāchọ: ma Nna-unu nāmata na ihe ndia di unu nkpà.

31 Otú ọ di, chọnu ala-eze-Ya, agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia.

32 Atula egwu, ìgwè aturu ntà; n’ihi na ọ di Nna-unu ezi nma inye unu ala-eze-Ya.

33 Renu ihe unu nwere, were ha lua ọlu ebere; merenu onwe-unu àkpà-ego nke nādighi-aka nká, àkù nādighi-agwu agwu n’elu-igwe, ebe onye-ori nādighi-abia nso, ebe nla nādighi-emebi kwa ihe.

34 N’ihi na ebe àkù-unu di, n’ebe ahu ka obi-unu gādi kwa.

35 Ka eke unu ihe-ọkiké n’úkwù, ka oriọna-unu nēnwu kwa;

36 unu onwe-unu, yikwara ndi nēche onye-nwe-ha, mb͕e ọ gēsi n’oriri ọlulu-nwunye laghachi; ka, mb͕e ọ gābia ku aka n’ọnu-uzọ, ka ha we meghere ya ngwa ngwa.

37 Ngọzi nādiri ndi-orù ahu, ndi, mb͕e onye-nwe-ha gābia, ọ gāhu ka ha nēche nche: n’ezie asim unu, na ọ gēke onwe-ya ihe-ọkiké n’úkwù, me ka ha nọdu na nri, ọ gābia kwa jere ha ozi.

38 Ọ buru kwa na ọ gābia na nche nke-abua, ọ buru kwa na nke-atọ, hu kwa ha otú a, ngọzi nādiri ndi-orù ahu.

39 Ma unu mara nka, na ọ buru na nna-nwe-ulo matarari oge hour onye-ori gābia, ọ ganēche nche, ọ gaghi-arapu kwa ulo-ya ka egwupú ya.

40 Unu onwe-unu buru kwa ndi edoziworo: n’ihi na n’oge hour nke unu nēchèghi ka Nwa nke madu gābia.

41 Pita we si, Onye-nwe-ayi, Ọ̀ bu ayi ka I nāturu ilu a, ma-ọbu madu nile kwa?

42 Onye-nwe-ayi we si, Ònye kwa bu onye ahu nāchi èzí-na-ulo, onye kwesiri ka atukwasi ya obi, nke nwe-kwa-ra uche, nke onye-nwe-ya gēme onye-isi èzí-na-ulo-ya, inye ha òkè nri ha n’oge-ya?

43 Ngọzi nādiri orù ahu, onye, mb͕e onye-nwe-ya gābia, ọ gāhu ya ka ọ nēme otú a.

44 N’ezie asim unu, na ọ gēme ya onye-isi ihe nile o nwere.

45 Ma ọ buru na orù ahu gāsi n’obi-ya, Onye-nwem nānọ ọdù di anya ibia; ọ buru kwa na ọ gāmalite iti ndikom na ndinyom nēje ozi aka, na iri ihe-oriri na iṅu ihe-ọṅuṅu, na iṅubiga manya ókè;

46 onye-nwe orù ahu gābia n’ubọchi ọ nēleghi anya ya, na n’oge hour ọ nāmaghi, ọ gēb͕ubi kwa ya nkpirikpi abua, ke òkè nye ya n’etiti ndi nēkwesighi ka atukwasi ha obi.

47 Ọzọ, orù ahu, nke mara ihe onye-nwe-ya chọrọ, ma o dozighi, o meghi kwa dika ọ chọrọ, agāpia ya ọtutu utari;

48 ma onye nāmaghi, me kwa ihe kwesiri ihe-otiti, agāpia ya utari ole-na-ole. Ọzọ, onye ọ bula enyere ihe uku, n’aka-ya ka agāchọ kwa ihe uku: onye ha nye-kwa-ra ihe uku n’aka idebe, n’aka-ya ka ha gāju ihe nke ka.

49 Abiaram itusa ọku n’elu uwa; ma gini ka M’nāchọ, ọ buru na afunwuwo ya-ri ub͕u a?

50 Ma enwerem baptism agēji mem baptism; ọ nēb͕ukwam nb͕u n’obi nke-uku rue mb͕e agēmezu ya.

51 Ùnu nēchè na abiaram inye udo n’uwa? asim unu, É-è; kama nkewa:

52 n’ihi na site n’ub͕u a madu ise ndi kewaworo ekewa gādi n’otù ulo, madu atọ megide madu abua, madu abua megide kwa madu atọ.

53 Agēkewa ha, nna megide nwa-ya nwoke, nwa-nwoke megide kwa nna-ya; nne megide nwa-ya nwanyi, nwa-nwanyi megide kwa nne-ya; nne di megide nwunye nwa-ya, nwunye nwa megide kwa nne di-ya.

54 O we si kwa ìgwè madu nile, Mb͕e ọ bula unu huru igwe-oji ka o si n’Ọdida-anyanwu nārigo, ngwa ngwa unu nāsi, Nshansha-miri nābia; o were mee otua.

55 Mb͕e ọ bula unu hukwara ifufe Ndida ka ọ nēfe, unu nāsi, Ifufe di ọku gādi; o we me.

56 Ndi-iru-abua, unu matara itule iru ala na elu-igwe; ma òle ka o si di na unu amataghi itule oge a?

57 Ma gini mere unu adighi-ekpe n’onwe-unu ihe ziri ezi?

58 N’ihi na mb͕e gi na onye nēkuru gi ga ikpé nāga n’iru onye-isi, mesie ike ipu n’aka-ya n’uzo; ka ọ ghara idọkpuru gi nye onye-ikpé ma eleghi anya, onye-ikpé gārara kwa gi nye n’aka onye nēnye ndi-nmehie ahuhu, onye ahu nēnye ndi nmehie ahuhu gātubà kwa gi n’ulo-nkpọrọ

59 Asim i, I gaghi-aputa n’ebe ahu ma-ọli, rue mb͕e i gākwughachi ọbuná ego ntà ikpe-azu.

Categories
LUK

LUK 13

1 Ma ufọdu nọ n’ebe ahu n’oge ahu ndi kọrọ Ya akukọ bayere ndi Galili ahu, ndi Pailat were ọbara-ha gwakọta n’àjà-ha.

2 O we za, si ha, Ùnu nēchè na ndi Galili ndia bu ndi-nmehie kari ndi Galili nile, n’ihi na ha ahuwo ahuhu ndia?

3 Asim unu, É-è: kama, ọ buru na unu echègharighi, unu nile gāla n’iyì otú ahu.

4 Ma-ọbu madu iri na asatọ ahu, ndi ulo-elu di na Sailoam dakwasiri ha, we b͕ue ha, ùnu nēchè na ndi ahu bu ndi ji ugwọ kari madu nile ndi bi na Jerusalem?

5 Asim unu, É-è; kama, ọ buru na unu echègharighi, unu nile gāla n’iyì otú a.

6 O we tua ilu a; Otù onye nwere osisi fig akuru n’ubi-vine-ya; o we bia nāchọ nkpuru n’elu ya, ma ọ hughi.

7 O we si onye-ọlu-vine-ya, Le, site n’arọ atọ rue ub͕u a ka m’nābia nāchọ nkpuru n’osisi fig a, ma ahughm: b͕utue ya; gini mere ọ nēme kwa ka ala la n’iyì?

8 O we za, si ya, Onye-nwe-ayi, rapu kwa ya arọ a, rue mb͕e m’gēgwu ala-ya buruburu, wusa kwa ya ǹsí-anu:

9 ọ buru kwa na ọ mia nkpuru site n’ub͕u a, ọ di nma; ma ọ buru na ọ mighi, i gēb͕utu ya.

10 O we nēzí ihe n’otù nime ulo-nzukọ-ha n’ubọchi-izu-ike.

11 Ma le, otù nwanyi nke nwere mọ nke nēme ka aru-ya ghara idi ike arọ iri na asatọ; o rudakwara ala, ọ pughi kwa iweli onwe-ya elu ma-ọli.

12 Ma mb͕e Jisus huru nwanyi ahu, Ọ kpọ ya, si ya, Nwanyi, emewo gi ka i pua na nriaria-gi.

13 O we tukwasi nwanyi ahu aka-Ya abua: ngwa ngwa ewe me ka o guzozie ọtọ, o we nye Chineke otuto.

14 Ma onye-isi ulo-nzukọ ahu, ebe iwe were ya nke-uku n’ihi na Jisus mere ka aru madu di ike n’ubọchi-izu-ike, ọ zara, si ìgwè madu ahu, Ubọchi isi di nke madu aghaghi ilu ọlu nime ha: ya mere, bianu nime ha ka eme ka aru-unu di ike, unu abiakwala n’ubọchi-izu-ike.

15 Ma Onye-nwe-ayi zara ya, si, Ndi-iru-abua; onye ọ bula nime unu, ọ̀ dighi-atọpu ehi-ya ma-ọbu inyinya-ibu-ya n’ulo anu-ulo n’ubọchi-izu-ike, duru ya ga ime ka ọ ṅua miri?

16 Ma nwanyi a, ebe ọ bu nwa Abraham, onye Setan kere ab͕u, le, arọ iri na asatọ, ò kwesighi ka atọpu ya n’ab͕ú a n’ubọchi-izu-ike?

17 Mb͕e Ọ nēkwu ihe ndia, ewe me ka ihere me ndi nile nēmegide Ya: ìgwè madu ahu nile nāṅuri kwa ọṅu n’ihi ihe-ebube nile Ọ nēme.

18 Ya mere O kwuru, si, Gini ka ala-eze Chineke yiri? gini ka M’gēji kwa tunyere ya?

19 O yiri nkpuru mustard, nke madu were, tubà n’ubi nke aka ya ab͕ara ogige; o we ba uba, ghọ osisi; anu-ufe nke elu-igwe we nọ n’alaka-ya.

20 Ọzọ kwa Ọ siri, Gini ka M’gēji tuyere ala-eze Chineke?

21 O yiri ihe nēko achicha, nke nwanyi were, zobe na mb͕é utu ọka atọ, rue mb͕e utu ọka ahu dum kosiri.

22 O we nāga n’obodo na obodo ntà di iche iche, nēzí ihe, nāga kwa ije-Ya iru Jerusalem.

23 Otù onye we si Ya, Onye-nwe-ayi, Ǹdi anāzọputa di madu ole-na-ole? O we si ha,

24 Jisienu ike isi n’ọnu-uzọ di warara ba: n’ihi na ọtutu madu, ka M’si unu, gāchọ ibà nime ya, ma ha agaghi-enwe ike.

25 Mb͕e Nna-nwe-ulo gēbiliwori, mechi kwa uzọ-Ya, unu we malite iguzo n’èzí, na iku aka n’ọnu-uzọ ahu, si Onye-nwe-ayi, meghere ayi uzọ; ma Ọ gāza, si unu, Amataghim unu, ebe unu si bia;

26 mb͕e ahu ka unu gāmalite isi, Ayi riri ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu n’iru Gi, I zíkwara ihe n’amá-ayi;

27 ma Ọ gāsi, Asim unu, amataghm ebe unu si bia; puanu n’irum, ndi nile nālu ọlu ajọ omume.

28 N’ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita ikekere-ezé ahu gādi, mb͕e unu gāhu Abraham, na Aisak, na Jekob, na ndi-amuma nile, n’ala-eze Chineke, ma unu onwe-unu aburu ndi achupuru n’èzí.

29 Ha gēsi kwa n’Ọwuwa-anyanwu na Ọdida-anyanwu, si kwa n’Ugwu na Ndida, bia, nọdu kwa n’ala-eze Chineke.

30 Ma le, ndi-ikpe-azu di ndi gēbu uzọ, ndi bu uzọ di kwa ndi gābu ndi-ikpe-azu.

31 N’oge hour ahu ndi-Farisi ufọdu biakutere Ya, si Ya, Pua, si n’ebe a la: n’ihi na Herod nāchọ ib͕u Gi.

32 O we si ha, Ganu, si nkita-ọhia ahu, Le, anamachupu ndi-mọ ọjọ, nāluzu kwa ọlu ime ka aru di madu ike ta na echi, n’ubọchi nke-atọ emekwam ka M’zu okè.

33 Otú ọ di, aghaghi m iga ta na echi na ubọchi so ya: n’ihi na apughi ikwe ka onye-amuma la n’iyì n’ebe nābughi Jerusalem.

34 Jerusalem, Jerusalem, nke nēb͕u ndi-amuma, nke nēwere kwa nkume atu ndi eziteworo ya! ọ̀tutu mb͕e ole ka M’chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nnekwu-ọkuku nāchikọ umu nke aka ya n’okpuru nkù-ya abua, ma unu achọghi!

35 Le, anārapuru unu ulo-unu: ma asim unu, Unu agaghi-ahum ma-ọli, rue mb͕e unu gāsi, Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n’aha Onye-nwe-ayi.

Categories
LUK

LUK 14

1 O rue, mb͕e Ọ batara n’ulo otù onye nime ndi-isi nke ndi-Farisi iri nri n’ubọchi-izu-ike, na ndi ahu nēche Ya nche.

2 Ma le, otù nwoke nọ n’iru Ya nke nwere ọria aru-miri.

3 Jisus we za, gwa ndi-iwu na ndi-Farisi okwu, si, Ò ziri ezi n’iwu ime ka aru madu di ike n’ubọchi-izu-ike, ma-ọbu na o zighi ezi?

4 Ma ha kpuchiri ọnu. O we jide ya aka, me ka aru di ya ike, we rapu ya ka ọ la.

5 O we si ha, Ọ̀ bu nwa-nwoke ma-ọbu ehi nke onye n’etiti unu gādabà n’olùlù-miri, ma onye ahu agaghi-adọkpulite ya elu ngwa ngwa n’ubọchi-izu-ike?

6 Ma ha enweghi ike iza okwu ndia ọzọ.

7 O we turu ndi akpọrọ ilu, mb͕e Ọ ribara ama otú ha nārọrọ isi ọnọdu; nāsi ha,

8 Mb͕e ọ bula madu gākpọ gi n’oriri ọlulu-nwunye, anọdula n’isi ọnọdu; ma eleghi anya ọ kpọwori otù onye ka gi na nsọpuru,

9 onye kpọrọ gi na ya we bia si gi, Nye nwoke a ọnọdu; mb͕e ahu i gāmalite iji ihere were ọnọdu ikpe-azu.

10 Ma mb͕e ọ bula agākpọ gi, ga nọdu n’ọnọdu ikpe-azu; ka, mb͕e onye kpọworo gi gābia, ka o we si gi, Eyìm, rigo n’ọnọdu ka elu: mb͕e ahu i gēnwe otuto n’iru ndi nile gi na ha nānọdu na nri.

11 N’ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ọzọ, onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.

12 O we si kwa onye kpọrọ Ya-ri, Mb͕e ọ bula i siri nri-ututu ma-ọbu nri-anyasi, akpọla ndi-eyì-gi, ma-ọbu umu-nne-gi, ma-ọbu ndi-ikwu-gi, ma-ọbu ndi-ab͕ata-obi-gi, bú ndi ọgaranya; ka ha onwe-ha we ghara ikpọghachi kwa gi ma eleghi anya, ewe nyeghachi gi ihe.

13 Kama mb͕e ọ bula i siri nri uku, kpọ ndi-ob͕eye, ndi-ọlusi, ndi-ngwurọ, ndi-ìsì:

14 onye-ngọzi ka i gābu; n’ihi na ha enweghi ihe inyeghachi gi: n’ihi na agēnyeghachi gi na nbilite-n’ọnwu nke ndi ezi omume.

15 Ma mb͕e otù onye nime ndi soro Ya nọdu na nri nuru ihe ndia, ọ si Ya, Ngọzi nādiri onye gēri nri n’ala-eze Chineke.

16 Ma Ọ siri ya, Otù nwoke siri nri-anyasi uku; we kpọ ọtutu madu:

17 o we zipu orù-ya n’oge hour nke nri-anyasi ahu isi ndi akpọwori, Bianu; n’ihi na edoziwo ihe nile ab͕u a.

18 Ma ha nile were otù olu malite iriọ ka arapu ha. Onye mbu siri ya, Azutaram ubi, ọ dikwam nkpà ipu gāle ya: ariọm gi guam n’onye riọrọ ka arapu ya.

19 Onye ọzọ si-kwa-ra, Azutaram ehi ọlu iri ejikọrọ abua abua, anamaga kwa inwa ha: ariọm gi guam n’onye riorọ ka arapu ya.

20 Onye ọzọ sikwara, Alurum nwunye, n’ihi nka apughi m ibia.

21 Orù ahu we bia, kọrọ onye-nwe-ya ihe ndia. Mb͕e ahu nna-nwe-ulo ahu, ebe iwe were ya, ọ si orù-ya, Pua ọsọsọ ga n’amá nile na uzọ ntà nile nke obodo, kpọbata n’ebe a ndi-ob͕eye na ndi-ọlusi na ndi-ìsì na ndi-ngwurọ.

22 Orù ahu we si, Onye-nwe-ayi, emewo ihe i nyere n’iwu, ọnọdu fọdu-kwa-ra.

23 Onye-nwe-ulo ahu we si orù-ya Pua ga n’uzọ nile na ogige nile, rugide kwa madu ka ha bata, ka ulom we juputa.

24 N’ihi na asim unu, na ọ dighi otù onye nime ndikom ahu ndi akpọworo gēdetu nri-anyasim ire.

25 Ma oké ìgwè madu nēso ya je: O we chigharia, si ha,

26 Ọ buru na onye ọ bula abiakutem, ma ọ kpọghi nna nke ya asì, ya na nne nke ya, na nwunye nke ya, na umu nke ya, na umu-nne-ndikom nke ya, na umu-nne-ndinyom nke ya, e, ndu nke aka ya kwa, ọ pughi ibu onye nēso uzọm.

27 Onye ọ bula nke nēbughi obe nke aka ya, sokwam n’azu, ọ pughi ibu onye nēso uzọm.

28 N’ihi na ònye nime unu, nke nāchọ íwu ulo-elu, nēbughi uzọ nọdu ala gu ego ọ gēwe, ma o nwere ego ọ gēji lusia ya?

29 Ka ndi nile ndi nāhu ya we ghara imalite ime ya ihe-ọchì ma eleghi anya, mb͕e ọ tọsiri ntọ-ala-ya, ma o nweghi ike iwuzu ya,

30 si, Nwoke a malitere iwu ulo, ma o nweghi ike iwusi ya.

31 Ma-ọbu òle eze, mb͕e ọ nāga ibu agha megide eze-ibe-ya, nāgaghi-ebu uzọ nọdu ala b͕a ìzù ma ọ puru ichi orú nnù ndi-agha na nnù ise zute onye chiri ọgu nnù ndi-agha abua na nnù iri bia imegide ya?

32 Ma ọ buru na ọ pughi, mb͕e onye ahu nọ n’ebe di anya ub͕u a, o ziga ndi-ozi, riọ ihe gēweta udo.

33 Ya mere otú a, onye ọ bula nime unu nke nāb͕akutaghi ihe nile o nwere azú, ọ pughi ibu onye nēso uzọm.

34 Ya mere, nnú di nma: ma asi na ọbuná nnú etufuwo utọ-ya, àgēji gini me ya ka ọ di utọ?

35 O kwesighi ala ma-ọbu ebe anēkpofu ǹsí-anu: ha nātupu ya n’èzí. Onye nwere nti inu ihe, ya nuru.

Categories
LUK

LUK 15

1 Ma ndi-ọna-utu na ndi-nmehie nile nābiaru Ya nso inu okwu-Ya.

2 Ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ we nātamu, si Nwoke a nānara ndi-nmehie nke-ọma, nēso kwa ha eri ihe.

3 O we tuara ha ilu a, si,

4 Òle madu di n’etiti unu, nke nwere ọgu aturu ise, ma otù nime ha funariri ya, nke nārapughi ọgu anọ na iri na iteghete ahu n’ọhia, ga so nke furu efu, rue mb͕e ọ gāchọputa ya?

5 Mb͕e ọ chọputaworo ya, we tukwasi ya n’ùbú-ya abua, nāṅuri.

6 Mb͕e ọ biaworo n’ulo, o we kpọkọta ndi-eyì-ya na ndi-ab͕ata-obi-ya, si ha, Sonum ṅuri ọṅu, n’ihi na achọputawom aturum furu efu.

7 Asim unu, na otú a ọṅu gādi n’elu-igwe n’isi otù onye-nmehie nke nēchèghari, kari n’isi ọgu ndi ezi omume anọ na iri na iteghete, ndi nchèghari nādighi nkpà.

8 Ma-ọbu òle nwanyi nke nwere shilling iri, ọ buru na otù shilling efunari ya, nāmuyeghi oriọna, za ulo-ya, chọsi ike rue mb͕e ọ gāchọputa ya?

9 Mb͕e ọ chọputaworo ya, o we kpọkọta ndi-eyì-ya na ndi-ab͕ata-obi-ya, si, Sonum ṅuri ọṅu, n’ihi na achọputawom shilling nke funariworom-ri.

10 Asim unu, na otù a ọṅù di n’iru ndi-mọ-ozi Chineke n’isi otù onye-nmehie nke nēchèghari.

11 O we si, Otù nwoke ji umu-ndikom abua:

12 nke bu nwata nime ha we si nna-ya, Nna, nyem òkè nke ihe i nwere nke rurum. O we kewara ha ihe nile o ji biri.

13 Mb͕e ọtutu ubọchi agabigaghi nwa-ya nke-nwata ahu we kporo ihe nile, je ala ọzọ di anya; n’ebe ahu ka o mefuru ihe o nwere n’idi ndu nke ila-n’iyì.

14 Ma mb͕e o mefusiri ihe nile, oké unwu siri ike dara n’ala ahu; ya onwe-ya we malite inọ na nkpà.

15 O we ga were onwe-ya rapara n’otù onye nime ndi amuru n’ala ahu; o we ziga ya n’ubi-ya izù ezì.

16 O we nāgu ya iwere mb͕ub͕ọ nke ezì nāta riju afọ-ya: ma ọ dighi onye ọ bula nēnye ya.

17 Ma mb͕e ọ mara onwe-ya ọ si, Ọ̀tutu ndi egoro ọlu ole nke nnam nwebigara ob͕e achicha ókè, ma mu onwem nāla n’iyì n’oké agu n’ebe a!

18 M’gebili jekuru nnam, m’gāsi kwa ya, Nna, emehiewom megide elu-igwe, na n’iru gi:

19 ekwesighi m ka akpọkwam nwa-gi ọzọ: mem ka m’di ka otù onye nime ndi nke gi egoro ọlu.

20 O we bilie, biakute nna-ya. Ma mb͕e ọ nọ n’ebe di anya ub͕u a, nna-ya huru ya, o we nwe ọmiko n’aru-ya, b͕a ọsọ, makua ya n’olu, sutu kwa ya ọnu nke-uku.

21 Nwa-ya we si ya, Nna, emehiewom megide elu-igwe, na n’iru gi: ekwesighi m ka akpọkwam nwa-gi ọzọ.

22 Ma nna-ya siri ndi-orù-ya, Chiputa uwe-nwuda nke kachasi nma ọsọsọ, were ya yikwasi ya; tiye kwa nb͕a-aka n’aka-ya, na akpukpọ-ukwu n’ukwu-ya:

23 sekputa kwa nwa-ehi azùru azù, b͕ue ya, ka ayi ri kwa, ka obi tọ kwa ayi utọ:

24 n’ihi na nwam nka nwururi anwu, o we di ndu ọzọ; o fururi efu, ewe hu ya. Ha we malite ime ka obi tọ ha utọ.

25 Ma nwa-ya nke-okenye nọ n’ubi: mb͕e ọ nābia ru ulo nso, o we nu olu abù na ite-egwú.

26 O we kpọ otù onye nime ndi nēje ozi ka ọ biakute ya, we jua ya ihe ha bu, bú ihe ndia.

27 O we si ya, Nwa-nne-gi abiawo; nna-gi eb͕uwo kwa nwa-ehi azùru azù, n’ihi na ọ nara ya n’aru-ike.

28 Ma o were iwe, ọ chọghi kwa ibà n’ulo: nna-ya we puta, riọ ya.

29 Ma ọ zara, si nna-ya, Le, ọtutu arọ ndia ka m’bu orù-gi, ọ dighi kwa mb͕e ọ bula m’rapuru ihe i nyere n’iwu: ma ọ dighi mb͕e ọ bula i nyerem nwa-ewu, ka obi we tọ mu na ndi-eyìm utọ:

30 ma mb͕e nwa-gi nka biara, nke ya na ndinyom ndi nākwa iko ripiara ihe nile i ji biri, i b͕uru nwa-ehi azùru azù nye ya.

31 O we si ya, Nwam, mu na gi nọ mb͕e nile, ihem nile bu kwa nke gi.

32 Ma ayi aghaghi ime ka obi tọ ayi utọ na iṅuri ọṅu: n’ihi na nwa-nne-gi nka nwururi anwu, o we di ndu ọzọ; o fukwara efu, ewe hu ya.

Categories
LUK

LUK 16

1 O we si kwa ndi nēso uzọ-Ya, Otù ọgaranya di, nke nwere onye nāchi èzí-na-ulo-ya; onye a ka eboro n’iru ya na ọ nēmefu ihe o nwere.

2 Ọ we kpọ ya, si ya, Ọ̀ bu gini bu nka nke m’nānu bayere gi? kọrọm akukọ nke ọchichi-èzí-na-ulo-gi; n’ihi na i pughi ichi èzí-na-ulo ọzọ.

3 Onye ahu nke nāchi èzí-na-ulo we kwue n’onwe-ya, si, Gini ka m’gēme, n’ihi na onye-nwem nānapum ọchichi-èzí-na-ulo a? Enweghi m ike igwu ala; ihere iriọ aririọ nēmem.

4 Amaram ihe m’gēme, ka, mb͕e ọ bula agēwepum n’ọchichi-èzí-na-ulo a, ka ha we kpọbatam n’ulo nke aka ha.

5 O we kpọ ndi nile ji onye-nwe-ya ugwọ n’otù n’otù, si onye mbu, Ùgwọ ole ka i ji onye-nwem?

6 Ọ si, Ọgu mb͕é manu ise. Ọ si ya, Were akwukwọ-gi, nọdu ọsọsọ, de ọgu abua na iri.

7 Mb͕e ahu ọ siri onye ọzọ, Ùgwọ ole ka gi onwe-gi ji kwa? Ọ si, Ọgu mb͕é ọka ise. Ọ si ya, Were akwukwọ-gi, de ọgu anọ.

8 Onye-nwe-ya we to onye ahu nāchi èzí-na-ulo nke nēme ajọ omume, n’ihi na o mere dika onye nwere uche: n’ihi na umu nke oge a nwere uche n’ebe ọb͕ọ nke aka ha nọ kari umu nke ìhè.

9 Mu onwem nāsi kwa unu, Menu ndi-eyi nye onwe-unu site n’àkù nke ajọ omume; ka, mb͕e ọ bula ọ gāgwu, ka ha we kpọbata unu n’ulo-ikwū ebighi-ebi.

10 Onye kwesiri ka atukwasi ya obi n’ihe dikarisiri ntà kwesi-kwa-ra ka atukwasi ya obi n’oké ihe: onye bu kwa onye ajọ omume n’ihe dikarisiri ntà bu kwa onye ajọ omume n’oké ihe.

11 Ya mere, ọ buru na unu abughi ndi kwesiri ka atukwasi unu obi n’àkù ajọ omume, ònye gēnye ezi àkù n’aka-unu na ntukwasi-obi idebe?

12 Ọ buru kwa na unu abughi ndi kwesiri ka atukwasi unu obi n’ihe onye ọzọ nwere, ònye gēnye unu ihe nke aka unu?

13 Ọ dighi onye ọ bula nke nēje ozi nke puru ibu orù nke nna abua: n’ihi na ọ gākpọ otù onye nime ha asì, hu ibe-ya n’anyá; ma ọ bughi otú a ọ gējide otù, lelìa ibe-ya anya. Unu apughi ibu orù Chineke na àkù.

14 Ma ndi-Farisi, ndi nāhu ego n’anya, nuru ihe ndia nile: ha we me Ya ihe-ọchì.

15 O we si ha, Unu onwe-unu bu ndi nāgu onwe-unu na ndi ezi omume n’anya madu; ma Chineke mara obi-unu: n’ihi na ihe di elu n’etiti madu bu ihe-árú n’anya Chineke.

16 Iwu Chineke na ndi-amuma-Ya di rue oge Jọn: site n’oge ahu anēzisa ozi ọma ala-eze Chineke, madu nile n’otù n’otù were ihe-ike nābà nime ya.

17 Ma ọ ka nfé ka elu-igwe na ala gabiga, kari na otù ihe dikarisiri ntà n’iwu ahu gāda.

18 Nwoke ọ bula nke nārapu nwunye-ya, nke luru kwa nwanyi ọzọ, ọ nākwa iko: onye nālu nwanyi nke di-ya rapuworo nākwa kwa iko.

19 Ma otù ọgaranya di, o nēyi kwa uwe ododo na ezi ákwà ọcha, ọ nēme kwa ka obi nātọ ya utọ nke-ọma kwa-ubọchi:

20 ma atọb͕ọrọri otù ob͕eye n’ọnu-uzọ-amá-ya, aha-ya bu Lazarọs, nke ọnyá juru ya n’aru,

21 onye ọ nāgu kwa ka ewere irighiri nri nke si na table nke ọgaranya ahu dapu me ka afọ ju ya; e, ọbuná nkita nābia racha ọnyá-ya.

22 O we rue na ob͕eye ahu nwuru, ndi-mọ-ozi we bupu ya ga n’ebe ọ dabere n’obì Abraham: ọgaranya ahu nwukwara, ewe lìe ya.

23 Nime Hedis o we welie anya-ya elu, ebe ọ nọ na nmekpa-aru, ọ hu Abraham n’ebe di anya, na Lazarọs ka ọ dabere n’obì-ya.

24 Ọgaranya ahu we kpọ òkù, si, Nna, Abraham, merem ebere, zite Lazarọs, ka ọ detu ọnu-ọ̀nu nkpisi-aka-ya na miri, we mejua irem; n’ihi na anọm n’aru-ufu nime ire-ọku a.

25 Ma Abraham síri, Nwam, cheta na i nara ezi ihe-gi na ndu-gi, otù ahu Lazarọs narakwara ajọ ihe-ya: ma ub͕u a anākasi ya obi n’ebe a, ma gi onwe-gi nọ n’aru-ufu.

26 Ma n’ihe ndia nile, emewo ka oké olùlù disie ike n’ab͕ata ayi na unu, ka ndi nāchọ isi n’ebe a gabiga ijekuru unu we ghara inwe ike, ka onye ọ bula ghara kwa isi n’ebe ahu gabiga biakute ayi.

27 O we si, Ya mere ariọm gi, nna, ka i ziga ya n’ulo nnam;

28 n’ihi na enwerem umu-nne ise; ka o we dọ ha aka na nti, ka ha onwe-ha ghara ibia kwa n’ebe nmekpa-aru a.

29 Ma Abraham siri, Ha nwere Moses na ndi-amuma; ka ha nuru olu-ha.

30 O we si, É-è, nna Abraham: kama ọ buru na otù onye esite na ndi nwuru anwu jekuru ha, ha gēchèghari.

31 O we si ya, Ọ buru na ha anughi olu Moses na ndi-amuma, agaghi-eme kwa ka ha kweye, asi na otù onye esi na ndi nwuru anwu bilie.

Categories
LUK

LUK 17

1 O we si ndi nēso uzọ-Ya, Ọ bu ihe nāghaghi ime na ihe di ìche iche nēme ka madu ma n’ọnyà gābia: ma ahuhu gādiri onye ahu, nke ha nēsite n’aka-ya bia.

2 Ọ gakara ya-ri mma ma akwuba ya nkume-igwe-nri n’olu, tubà kwa ya n’oké osimiri, kari na ọ gēme ka otù onye nime ndi ntà ndia ma n’ọnyà.

3 Nēzenu onwe-unu: ọ buru na nwa-nna-gi emehie, bara ya nba; ọ buru kwa na ọ chègharia, b͕aghara ya.

4 Ọ buru kwa na o mehiere megide gi ub͕ò asa n’otù ubọchi, we chigharia ọzọ n’ebe i nọ ub͕ò asa, si, Echègharim; i gāb͕aghara ya.

5 Ndi-ozi-Ya we si Onye-nwe-ayi, Tukwasiri ayi okwukwe.

6 Onye-nwe-ayi we si, Ọ buru na unu nwere okwukwe dika nkpuru mustard, unu gāsi osisi sycamine nka, Ka eropu gi, ku kwa gi n’oké osimiri; ọ gāṅa kwa unu nti.

7 Ma ònye n’etiti unu, asi na o nwere orù nke nālu ọlu ubi ma-ọbu nke nāzù aturu, gāsi ya, mb͕e o si n’ubi bata n’ulo, Bia ngwa ngwa nọdu na nri;

8 nke nāgaghi-asi kwa ya kama nke ahu, Dozie ihe m’gēri na nri-anyasi, ke kwa ihe-ọkiké n’úkwù-gi, nējerem ozi, rue mb͕e m’risiri ṅu kwa; ma emesia gi onwe-gi gēri ṅu kwa?

9 Ọ̀ nwere ekele n’ebe orù ahu nọ n’ihi na ọ mere ihe akaworo àkà?

10 Otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gēmesi ihe nile akaworo àkà nye unu, sinu, Ayi bu orù ndi nābaghi n’ihe; ayi emewo ihe ayi ji ugwọ ime.

11 O rue, mb͕e ha nāga Jerusalem, na Ya onwe-ya nāgabiga n’etiti Sameria na Galili.

12 Mb͕e Ọ nābà n’otù obodo ntà, ndikom iri, bú ndi-ekpenta, we zute Ya, ndi guzoro n’ebe di anya:

13 ha we welie olu-ha elu, si, Jisus, Nna-ayi, mere ayi ebere.

14 Mb͕e Ọ huru ha, O we si ha, Ganu, were onwe-unu gosi ndi-nchu-àjà. O we rue, mb͕e ha nāga, na emere ka aru-ha di ọcha.

15 Ma otù onye n’etiti ha, mb͕e ọ huru na emere ka aru di ya ike, ọ laghachi, were oké olu nenye Chineke otuto;

16 o we da kpuchie iru-ya n’ala n’ukwu-Ya, nēkele Ya: onye ahu bu kwa onye Sameria.

17 Ma Jisus zara, si, Èmeghi ka aru ndikom iri ahu di ọcha? ma òle ebe iteghete fọduru no?

18 Àhughi ndi laghachiri inye Chineke otuto, ma-ọbughi onye ala ọzọ a?

19 O we si ya, Bilie, ga nke gi: okwukwe-gi azọputawo gi.

20 Ma mb͕e ndi-Farisi juru Ya mb͕e ala-eze Chineke gābia, Ọ zara ha, si, Ala-eze Chineke adighi-abia mb͕e madu nēche nche:

21 ha agaghi-asi kwa, Le, n’ebe a! ma-ọbu, N’ebe ahu! n’ihi na le, ala-eze Chineke di n’etiti unu.

22 O we si ndi nēso uzọ-Ya, Ubọchi gāba, mb͕e agu ihu otù nime ubọchi Nwa nke madu gāgu unu, ma unu agaghi-ahu ya.

23 Ha gāsi kwa unu, Le, n’ebe ahu! Le, n’ebe a! unu ejela, unu esokwala ha:

24 n’ihi na dika àmùmà, mb͕e ọ nēb͕u àmùmà site n’otù akuku n’okpuru elu-igwe, ọ nēnwu rue akuku ọzọ n’okpuru elu-igwe; otú a ka Nwa nke madu gādi n’ubọchi-Ya.

25 Ma Ọ ghaghi ibu uzọ hu ọtutu ahuhu, aghaghi kwa iju Ya site n’ọb͕ọ a.

26 Ma dika emere n’ubọchi Noa, otú a ka ọ gādi kwa n’ubọchi Nwa nke madu.

27 Ha nēri ihe, ha nāṅu ihe-ọṅuṅu, ha nālu nwunye, anēnye ha n’ọlulu-di, rue ubọchi Noa batara n’ub͕ọ-ya, oké iju-miri ahu we bia, la ha nile n’iyì.

28 Otú ahu dika emere n’ubọchi Lot; ha nēri ihe, ha nāṅu ihe-ọṅuṅu, ha nāzú, ha nēre, ha nāku ihe n’ubi, ha nēwu ulo;

29 ma n’ubọchi Lot siri na Sọdọm puta ọku na brimstone si n’elu-igwe zò, we la ha nile n’iyì:

30 n’otù aka ahu ka ọ gādi n’ubọchi agēkpughe Nwa nke madu.

31 N’ubọchi ahu, onye gānọ n’elu ulo, ma ihe-ya di nime ulo, ya ghara iridata ikwapu ha: otú ahu onye nọ kwa n’ubi, ya ghara ilaghachi.

32 Chetanu nwunye Lot.

33 Onye ọ bula nke gāchọ uzọ izutara onwe-ya ndu-ya, o gētufu ya: ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya gēme ya ka ọ di ndu.

34 Asim unu, N’abali ahu madu abua gādi n’elu otù ihe-ndina; agēwere otù nime ha, rapu ibe-ya.

35 Ndinyom abua ganēgwekọ nri n’otù ebe; agēwere otù nime ha, ma agārapu ibe-ya.

36 Madu abua gāno kwa n’ubi; agēwere otù rapu kwa ibe-ya.

37 Ha we za, si Ya, Òle ebe, Onye-nwe-ayi? Ọ si ha, Ebe ozu di, n’ebe ahu ka udele gēzukọ kwa.