Categories
HOSEA

HOSEA 9

1 Aṅurila, Israel, rue otite-egwú-ọṅù, dika ndi nile di iche iche; n’ihi na i puwo n’aka Chineke-gi kwaba iko, i huwo onyinye n’anya n’ebe-nzọcha-ọka nile.

2 Ebe-nzọcha-ọka na ebe-nzọcha-nkpuru-vine agaghi-azù ha, manya-vine ọhu gēbilata-kwa-ra ya.

3 Ha agaghi-ebi n’ala Jehova; ma Efraim gālaghachi n’Ijipt, ọ bu kwa n’Asiria ka ha gēri ihe ruru árú.

4 Ha agaghi-awusiri Jehova àjà manya-vine, àjà di iche iche ha agaghi-atọ kwa Ya utọ: dika nri ndi nēru újú ka nri-ha gādiri ha; ndi nile ndi nēri ya gāghọ ndi ruru árú: n’ihi na nri-ha gādiri ọchichọ nkpuru-obi-ha; ọ gaghi-abata n’ulo Jehova.

5 Gini ka unu gēme n’ubọchi nke mb͕e ákàrà, na n’ubọchi ememe Jehova?

6 N’ihi na, le, ha esiwo na nbibi la, ma Ijipt gāchikọta ha, Memfis gēlì ha: ihe ọla-ọcha ha anāchọsi ike, akuba gēnweta ha: ogwu gādi n’ulo-ikwū nile ha.

7 Ubọchi nile nke nleta abiawo, ubọchi nkwughachi abiawo; Israel gāma ya: onye b͕agọrọ ab͕agọ n’uche-ya ka onye-amuma bu, onye-ara ka onye nwere Mọ Chineke bu, n’ihi iba-uba nke ajọ omume-gi, na n’ihi na ihe bara uba ka ikpọ-asì ahu bu.

8 Onye-nche ka Efraim bu n’aka Chinekem: ma onye-amuma, ib͕udu nke osi-ọnyà di n’uzọ-ya nile, ikpọ-asì di kwa n’ulo Chineke-ya.

9 Ha abamiwo n’ibibi onwe-ha, dika n’ubọchi nke Gibea: Ọ gēcheta ajọ omume-ha, leta nmehie nile ha.

10 Dika nkpuru-vine n’ọzara ka M’chọtara Israel; dika nkpuru nke buru uzọ cha n’osisi fig n’oge mbu ya ka M’huru nna-unu-hà: ma ha onwe-ha biakutere Beal-peoa, kewaputa onwe-ha nye ihere ahu, ghọ ihe-árú dika ihe ahu ha huru n’anya.

11 Efraim, dika anu-ufe ka nsọpuru-ha gēfepu: ọmumu-nwa na idi-ime na itu-ime ewe ghara idi.

12 E, ọ buru na ha azulite umu-ha, ma M’gāb͕aba ha aka nwa, madu ọ bula ewe ghara idi: e, ahuhu di-kwa-ra ha mb͕e M’gēsi n’aru ha wezuga Onwem!

13 Efraim, dika M’leworo Taia anya, bú ihe akuworo n’ebe mara nma: ma Efraim aghaghi ichiputara ob͕u-madu umu-ya.

14 Nye ha, Jehova: gini ka I gēnye? nye ha afọ nēmebi ime na ara kpọrọ nku.

15 Ihe ọjọ nile ha di nime Gilgal: n’ihi na n’ebe ahu ka M’kpọrọ ha asì: n’ihi ihe ọjọ nke omume nile ha ka M’gāchupu ha n’ulom: M’gaghi-ahu kwa ha n’anya ọzọ; ndi-isi-ha nile bu ndi nēwezuga onwe-ha.

16 Etib͕uwo Efraim, nkpọrọgwu-ha akpọnwuwo, ha agaghi-ami nkpuru: e, asi na ha amua nwa, ma M’gēme ka umu afọ-ha anāchọsi ike nwua.

17 Chinekem gāju ha, n’ihi na ha egeghi Ya nti: ha gābu kwa ndi nāwaghari n’etiti mba nile.

Categories
HOSEA

HOSEA 10

1 Osisi vine nke nēkosa ekosa ka Israel bu, nkpuru ka ọ nāmiziri onwe-ya: ọ bu dika iba-uba nke nkpuru-ya si di ka o mere ka ebe-ichu-àjà-ya ba uba; ọ bu dika ọdi-nma nke diri ala-ya si di ka ha mere ka ogidi nile di nma.

2 O kesawo obi-ha; ub͕u a ka ikpe gāma ha: Ya onwe-ya gētipia ebe-ichu-àjà nile ha, bibie ogidi nile ha.

3 N’ezie ub͕u a ka ha gāsi, Ọ dighi eze ayi nwere: n’ihi na ayi atughi egwu Jehova; ma eze, gini ka ọ gēmere ayi?

4 Ha ekwuwo okwu efu di iche iche, ha nāb͕a iyi ugha, ha nāb͕a ndu: ikpe ewe pulite dika hemlok nime ọ̀b͕à ubi.

5 Ọ bu bayere umu-ehi nke Bet-even ka ndi bi na Sameria gātu ujọ: n’ihi na ndi-ya gēruru ya újú, ha na ndi-nchu-àjà-ya ndi nētere ya-ri egwú ọṅù, n’ihi nsọpuru-ya, n’ihi na o siwo n’ebe ọ nọ je biri n’ala ọzọ.

6 Ọ bu kwa ihe ahu ka agēduga n’Asiria, ibu onyinye-inata-iru-ọma agēnye eze, bú Jereb: ihere ka Efraim gānata, ihere ndum-ọdu-ya gēme kwa Israel.

7 Emewo ka Sameria la n’iyì, ya na eze-ya, dika irighiri-osisi n’elu miri.

8 Agēkpochapu kwa ebe nile di elu nke Even, bú nmehie Israel: ogwu na uke gēpulite n’ebe-ichu-àjà nile ha; ha gāsi kwa ugwu nile, Kpuchienu ayi; ha gāsi kwa ugwu ntà nile, Dakwasinu ayi.

9 Site n’ubọchi Gibea ka i mehieworo, gi Israel: n’ebe ahu ka ha guzoro; ka agha anēbuso umu ajọ omume we ghara irute ha nime Gibea.

10 Mb͕e M’chọrọ, M’gādọ ha aka na nti; agāchikọta kwa ndi nile di iche iche imegide ha, mb͕e agēke ha ab͕u n’ajọ omume-ha abua.

11 Efraim bu kwa nwa-ab͕ọghọ-ehi nke emeworo ka ọ muta ihe, nke nāhu izọcha ọka n’anya; ma Mu onwem agabigawo n’elu olu-ya di nma: M’gēme ka anọkwasi Efraim dika inyinya; Juda gādọ ihe eji gwu ala-ubi, Jekob gētipiara ya ájá.

12 Gharanu onwe-unu nkpuru n’ezi omume, wenu ihe-ubi dika ebere si di; lucharanu onwe-unu ubi: n’ihi na ọ bu mb͕e ichọ Jehova, rue mb͕e Ọ gābia, zokwasi unu ezi omume dika miri.

13 Unu aluwo nmebi-iwu dika ubi, ajọ omume ka unu weworo dika ihe-ubi; unu eriwo nkpuru okwu-ugha: n’ihi na i tukwasiri uzọ-gi obi, n’iba-uba nke ndi-dike-gi.

14 Nkpọtu gēbili kwa n’etiti umu-nna-gi, ọ bu kwa ebe-gi nile ewusiri ike ka agēbibi, dika Shalman bibiri Bet-abel n’ubọchi agha: nne n’elu umu-ya ka atupiara.

15 Otú a ka Bet-el gēme unu n’ihi ihe ọjọ unu nke kachasi ihe ọjọ nile: na chi-ọbubọ ka agēme ka eze Israel lasia n’iyì.

Categories
HOSEA

HOSEA 11

1 Mb͕e Israel bu nwata, ahurum ya n’anya, ọ bu kwa site n’Ijipt ka M’kpọputara nwam.

2 Dika ha kpọrọ ha òkù, otú a ka ha puru n’iru ha nēje: Bealim ka ha churu àjà, surere arusi di iche iche apiri api ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

3 Ma Mu onwem nēzí Efraim ije ije; O kuru ha n’ogwe-aka-Ya abua; ma ha amataghi na emerem ka aru di ha nma.

4 Achirim udọ̀ madu, bú ihe-nhiegide ihu-n’anya, adọ ha; M’we diri ha dika ndi nēbuli yoke n’elu ab͕a-ha, anameseti kwa akam me ka ha rie ihe.

5 Ọ gaghi-alaghachi n’ala Ijipt; ma onye Asiria ahu gābu eze-ya n’ihi na ha juru ilaghachi.

6 Mma-agha gēfeghari kwa n’obodo-ya nile, me ka ihe-ntuchi-ya nile gwusia, ripia ha, site na ndum-ọdu nile ha.

7 N’ihi na ndim nākwughari efekefe n’obi idaghachi azu site n’ebe M’nọ: ọ bu ezie na Onye nke nọ n’elu ka ha nākpọ ha ibiakute, ma ọ dighi otù onye efu gēbuli onwe-ya elu.

8 M’gēsi aṅa rara gi nye, Efraim? M’gēsi aṅa nyebiga gi, Israel? M’gēsi aṅa me gi ka i di ka Adma? M’gēsi aṅa do gi ka Zeboim? obim ab͕aghariwo n’arum, obi-eberem nile di ọku n’otù.

9 M’gaghi-emezu idi-ọku nke iwem, M’gaghi-alaghachi ibibi Efraim: n’ihi na Chineke ka M’bu, abughm madu; n’etiti gi ka Mu, bú Onye nsọ, nọ: M’gaghi-abata kwa n’obodo.

10 Jehova ka ha gējeso, dika ọdum ka Ọ gāb͕ọ uja; N’ihi na Ya onwe-ya gāb͕ọ uja, umu gesi kwa n’Ọdida-anyanwu bia nāma jijiji.

11 Ha gēsi n’Ijipt bia nāma jijiji dika nnunu, si kwa n’ala Asiria dika nduru: M’gēme kwa ka ha biri n’ulo nile ha: ọ bu ihe si n’ọnu Jehovaa puta.

12 Efraim ji okwu-ugha ab͕am buruburu, ọ bu kwa aghughọ ka ulo Israel ji: Juda nọ kwa nālupu alupu n’aka Chineke, bú n’aka Onye kachasi nsọ Nke kwesiri ntukwasi-obi.

Categories
HOSEA

HOSEA 12

1 Efraim ji ifufe azù onwe-ya, ọ nāb͕aso kwa ifufe Iru-anyanwu: ogologo ubọchi nile ọ nēme ka okwu-ugha na nbibi ba uba; ha na Asiria nāb͕a kwa ndu, anēbuga kwa manu n’Ijipt.

2 Jehova nwe-kwa-ra ikpe Ya na Juda gēkpe, Ọ gēji kwa nmehie Jekob leta ya dika uzọ-ya nile si di; dika omume-ya nile si di ka Ọ gēnyeghachi ya.

3 Mb͕e ọ nọ n’afọ o jidere nwa-nne-ya n’ikiri-ukwu; ọ bu kwa n’ume-ya ka o jisiri ike n’ebe Chineke nọ:

4 o we jisie ike n’aru Mọ-ozi, we nwe ike kari: ọ kwara ákwá, riọ Ya aririọ: nime Bet-el ka Ọ chọtara ya, ọ bu kwa n’ebe ahu ka Ọ kpayere ayi uka;

5 ọbuná Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha; Jehova bu aha-ncheta-Ya.

6 Ma gi onwe-gi, nime Chineke-gi ka i gālata: debe ebere na ikpé ziri ezi, le kwa anya Chineke-gi mb͕e dum.

7 Kenean! n’aka-ya ka ihe-ọtùtù aghughọ di: ọ huru imeb͕u emeb͕u n’anya.

8 Efraim we si, N’ezie aghọwom ọgaranya, achọtaworom onwem àkù: ihe nile m’nādọb͕u onwem n’ọlu inweta agaghi-achọtaram ajọ omume nke bu nmehie.

9 Ma Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, site n’ala Ijipt; M’gēme kwa ka i biri n’ulo-ikwū ọzọ, dika n’ubọchi nile nke mb͕e akara àkà.

10 Agwawokwam ndi-amumam okwu, ọ bu kwa Mu onwem mere ka ọhù ba uba; ọ bu kwa site n’aka ndi-amuma ka M’ji ihe ama àtù.

11 Ọ buru na Gilead bu ajọ ihe, nání ihe-efu ka ha ghọworo; nime Gilgal ha nāchu àjà oke-ehi di iche iche: e, ebe-ichu-àjà nile ha di ka obo-ihe n’ọ̀b͕à ubi.

12 Jekob we b͕alaga n’ọhia Efraim, Israel we fè òfùfè n’ihi nwunye, ọ bu kwa n’ihi nwunye ka o debere aturu.

13 Ọ bu kwa onye-amuma ka Jehova jiri me ka Israel si n’Ijipt rigoputa, ọ bu kwa onye-amuma ka ejiri debe ya.

14 Efraim akpasuwo iwe oké ilu: ọ bu kwa iwusi-ọbara-madu-ya ka Ọ gārapu n’aru ya, ọ bu kwa ita-uta-ya ka Onye-nwe-ya gēnyeghachi ya.

Categories
HOSEA

HOSEA 13

1 Mb͕e Efraim jiri ima-jijiji kwu okwu, ya onwe-ya buliri onwe-ya elu n’Israel: ma ikpe mara ya nime Beal, o we nwua.

2 Ma ub͕u a ha nēmehie kari, we mere onwe-ha arusi apiri api site n’ọla-ọcha-ha, bú arusi di iche iche dika nghọta-ha si di, ọlu nke ndi-ọ̀kà ka ha nile bu: ọ bu bayere ihe ndia ka ha onwe-ha nēkwu okwu, si, Ka ndi nāchu àjà madu sutue umu-ehi ọnu.

3 N’ihi nka ka ha gādi ka igwe-oji ututu, na dika igirigi nke nāla n’isi-ututu, dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēfechapu n’ebe-nzọcha-ọka, na dika anwuru-ọku si apu na window.

4 Ma Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, site n’ala Ijipt; ọ dighi kwa chi, ma-ọbughi náním, i gāmara, onye-nzọputa adighi kwa, ma-ọbughi náním.

5 Mu onwem mara gi n’ọzara, n’ala kpọrọ oké nku.

6 Dika ọtita-nri-ha si di, otú a ka afọ juru ha; afọ juru ha, obi-ha we di elu; n’ihi nka ka ha chezọworom.

7 M’we diri ha ka ọdum: dika agu, ọ bu n’uzọ ka M’gēche anwu:

8 M’gādakwasi ha dika anu-ọhia bear nke b͕ara aka nwa, M’gādọwa anu-aru b͕ochiri obi-ha: M’gēri ha n’ebe ahu dika ọdum; anu ọhia gādọka ha.

9 Ọ bu nbibi-gi, Israel, na i nēmegidem, nēmegide iye-aka-gi.

10 Òle ebe eze-gi nọ ub͕u a, ka o we zọputa gi n’obodo-gi nile? òle ebe ndi-ikpe-gi nọ, ndi i kwuru okwu bayere ha, si, Nyem eze na ndi-isi?

11 Enyem i eze n’iwem, anapukwam ya nime nrubiga-ókè nke iwem.

12 Ihe ekechiri ekechi ka ajọ omume Efraim bu; ihe ezobere ezobe ka nmehie-ya bu.

13 Ihe-nb͕u nile nke nwanyi ime nēme gābiakute ya: ya onwe-ya bu nwa nāmaghi ihe; mb͕e oge eruwo ọ dighi-eguzo n’ebe ib͕ọwaputa umu.

14 N’aka ala-mọ ka M’gēsi b͕aputa ha; n’aka ọnwu ka M’gēme ka ha si pua nwere onwe-ha: òle ebe ajọ ọria-gi nile nke nēfe efe di, gi ọnwu? òle ebe nbipu-gi di, gi ala-mọ? agēzonari anyam abua nchèghari.

15 Ọ bu ezie na ya onwe-ya nāmi nkpuru n’etiti umu-nne-ya, ma ifufe Iru-anyanwu gābia, bú ifufe Jehova nke nēsi n’ọzara fegota, ọmi-ya ewe ta, isi-iyi-ya gāmikọ kwa: nke ahu gāpunara ya àkù nke ihe ọ bula anāchọsi ike.

16 Sameria gāhu ahuhu ikpe-ọmuma-ya; n’ihi na ọ nupuwo isi n’okpuru Chineke-ya: site na mma-agha ka ha gāda; agātupia umu-ntakiri-ha, agāb͕awa kwa ndinyom-ha di ime afọ.

Categories
HOSEA

HOSEA 14

1 Israel, laghachikute Jehova, bú Chineke-gi; n’ihi na i suwo ngọngọ site n’ajọ omume-gi.

2 Chirinu okwu n’aka-unu laghachikute Jehova: sinu Ya, Bupu ajọ omume nile ayi, nara ezi ihe: ayi ewe kwughachi eb͕ub͕ere-ọnu-ayi, dika oke-ehi.

3 Asiria agaghi-azọputa ayi; ọ bughi n’elu inyinya ka ayi gānọkwasi: ayi agaghi-asi kwa ọlu aka-ayi ọzọ, Chi-ayi ka unu bu: n’ihi na ọ bu nime Gi ka nwa-nb͕ei nāchọta obi-ebere.

4 M’gāgwọ ndaghachi-azu-ha, M’gāhu ha n’anya n’afọ-ofufo: n’ihi na iwem esiwo n’aru ya chigharia.

5 M’gādiri Israel dika igirigi, ọ gāma ifuru dika urodi, b͕asa nkpọrọgwu-ya nile dika Lebanon.

6 Ome-ya nile gāwasa, ima-nma-ya gādi kwa ka osisi olive, ísì ọma o nēsì gādi ka Lebanon.

7 Ndi bi n’okpuru ǹdò-ya gālata, me ka ọka di ndu, ha gāma ifuru dika osisi vine: ihe-ncheta-ya gādi ka manya-vine nke Lebanon.

8 Efraim gāsi, Gini ka mu na arusi di iche iche nwekọrọ ọzọ? Mu onwem azawo, M’gēlegide kwa ya anya: mu onwem di ka osisi di ndu; esi nam chọta nkpuru-gi.

9 Ònye bu onye-amam-ihe? ọ gāghọta kwa ihe ndia; ònye bu onye-nghọta? ọ gāma kwa ha. N’ihi na uzọ nile nke Jehova ziri ezi, ndi ezi omume gēje kwa ije nime ha; ma ndi-njehie gāsu ngọngọ nime ha.

Categories
JOEL

JOEL 1

1 Okwu Jehova nke ruru Joel, nwa Petuel, nti.

2 Nurunu nka, unu ndi-okenye, ṅa-kwa-nu nti, unu ndi nile bi n’ala nka. Nka, ọ̀ diwo n’ubọchi-unu? mà-ọbu n’ubọchi nna-unu-hà?

3 Kọrọnu ya umu-unu, ka umu-unu kọ-kwa-ra umu-ha, ka umu-ha kọ-kwa-ra ọb͕ọ ọzọ.

4 Ihe palmer-worm rifọworo ka igurube riworo; ihe igurube rifọworo ka ukpala riworo; ihe ukpala rifọworo ka ọbubu riworo.

5 Tetanu, unu ndi nāṅubiga manya ókè, kwanu ákwá; kwasi-kwa-nu ákwá ike, unu nile ndi nāṅu manya-vine, n’ihi manya utọ; n’ihi na ebipuwo ya n’ọnu-unu.

6 N’ihi na otù mba arigokwasiwo n’alam, o nwere ume, nādighi kwa ọnu-ọgugu; ezé-ya nile di ka ezé ọdum, o nwe-kwa-ra ikiri-ezé nke nne-ọdum.

7 O mewo ka osisi vine nkem ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu, o mewo ka osisi fig nkem ghọ irighiri-osisi: o kpechapusiwo nb͕ub͕ọ-ya, kpofue ya; emewo ka alaka-ya nile di ọcha.

8 Kwa ákwá dika nwa-ab͕ọghọ nke ekeworo ákwà-nkpe n’ihi di o nwere na nwata.

9 Ebipuwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n’ulo Jehova; ndi-nchu-àjà, bú ndi nējere Jehova ozi, eruwo újú.

10 Emebiwo ubi, ala eruwo újú; n’ihi na emebiwo ọka, ihere emewo manya-vine ọhu, manu ọhu atalatawo.

11 Ka ihere me unu, ndi-ubi, kwasienu ákwá ike, unu ndi-ubi-vine, bayere ọka wheat, baye-kwa-ra ọka barley; n’ihi na owuwe-ihe-ubi alawo n’iyì.

12 Ihere emewo osisi vine, osisi fig atalatawo; osisi pomegranate, nkwu kwa, na osisi apple, osisi nile nke ọhia akpọnwuwo akpọnwu: n’ihi na ihere emewo obi-utọ, ọ pua n’aru umu madu.

13 Kenu ákwà-nkpe n’úkwù-unu, ti-kwa-nu aka n’obi, unu ndi-nchu-àjà; kwasienu ákwá ike, unu ndi-oje-ozi nke ebe-ichu-àjà; bianu, nọ ọnọdu-abali n’ákwà-nkpe, unu ndi nējere Chinekem ozi: n’ihi na eb͕ochiwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n’ulo Chineke-unu.

14 Donu obubu-ọnu nsọ, Kpọnu ubọchi nb͕ochi, chikọtanu ndi-okenye na ndi nile bi n’ala n’ulo Jehova, bú Chineke-unu, tiku-kwa-nu Jehova.

15 Ewó, ubọchi ahu! n’ihi na ubọchi Jehova di nso, dika nbibi nke sitere n’aka Onye puru ime ihe nile ka ọ gābia.

16 Ọ̀ bughi na ncherita-iru anya-ayi ka ebipuworo ihe-oriri, e, ọṅù na otite-egwú-ọṅù n’ulo Chineke-ayi?

17 Nkpuru-ọghigha akpọnwuwo n’okpuru ọkpurukpu-ájá-ha; emewo ka ulo nile anēdebe ihe-oriri tọb͕ọrọ n’efu, akwatuwo ọba nile; n’ihi na ihere emewo ọka.

18 Le otú anu-ulo ezewo ume nke-uku! ọ nāb͕a ìgwè ehi nile ghari, n’ihi na ọ dighi nri-ọtita ha nwere; e, ìgwè ewu na aturu nile ahuwo ahuhu ikpe-ọmuma.

19 Ọ bu Gi, Jehova, ka m’nākpọku: n’ihi na ọku erichapuwo ebe-ita-nri nile nke ọzara, ire-ọku esuyewo kwa ọku n’osisi nile nke ọhia.

20 Ọzọ, agu Gi nāgu anu ọhia nile: n’ihi na ebe nile miri si erù atasiwo, ọku eripiawo kwa ebe-ita-nri nile nke ọzara.

Categories
JOEL

JOEL 2

1 Fùanu opì-ike nime Zaion, ti-kwa-nu nkpu agha n’ugwu nsọm; ka ndi nile ndi bi n’ala nka ma jijiji: n’ihi na ubọchi Jehova nābia, n’ihi na ọ di nso;

2 ọ bu ubọchi ọchichiri na oké nb͕achi, ubọchi igwe-oji na oké ọchichiri, dika chi-ọbubọ nke bọsaworo n’elu ugwu nile; otù ndi nābia di ọtutu nwe kwa ume, ihe di ka ha adighi site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, mb͕e ha gasiri ihe di ka ha agaghi-adi ọzọ, rue arọ nile nke ọb͕ọ na ọb͕ọ.

3 N’iru ha ka ọku nēripia ihe; ọ bu kwa n’azu ha ka ire-ọku nēsuye ọku esuye: dika ubi ahu ab͕ara ogige, bú Iden, ka ala di n’iru ha, n’azu ha ọ bu ọzara tọb͕ọrọ n’efu; e, ọ dighi kwa ihe ọ bula b͕apuworo n’aka-ha.

4 Dika inyinya si di n’ile ha anya, otú a ka ha di n’ile ha anya; e, dika ndi-inyinya, otú a ka ha nāb͕a ọsọ.

5 Dika olu ọtutu ub͕ọ-ala n’elu ugwu ka ha nāmali amali, dika olu ire-ọku nke nēripia ahihia-ọka, dika otù ndi nke nwere ume nke edoworo n’usoro agha.

6 N’iru ha ndi nile di iche iche nāb͕ali: iru nile achagharisiwo.

7 Dika ndi-dike ka ha nāb͕a ọsọ; dika ndi-agha ka ha nārigo mb͕idi; onye ọ bula n’uzọ-ya nile, otú a ka ha nāga ije, ha adighi-agwab͕u kwa agwab͕u n’ojije nile ha.

8 Ha adighi-enurita onwe-ha; onye ọ bula n’uzọ-ya atuliri atuli, otú a ka ha nāga ije: ọ bu kwa n’etiti ihe-agha ka ha nāda nējebìghi ije-ha.

9 N’obodo ka ha nāb͕aghari; n’elu mb͕idi ka ha nāb͕a ọsọ; n’ulo ka ha nārigobata; ha si na window nile abà nime dika onye-ori.

10 N’iru ha ka ala maworo jijiji; elu-igwe emewo nkpatu: anyanwu na ọnwa ejiwo nji, kpakpando achikọpuwo kwa onwunwu-ha:

11 Jehova emewo kwa ka olu-Ya da n’iru usu-ndi-agha-Ya; n’ihi na ihe bara uba nke-uku ka ọmuma-ulo-ikwū-Ya bu; n’ihi na onye nwere ume ka onye nēme ihe O kwuru bu: n’ihi na ubọchi Jehova di uku di kwa egwu nke-uku; ònye kwa gānagide ya?

12 Ma ọbuná ub͕u a, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), werenu obi-unu nile, werekwa obubu-ọnu, were kwa ikwa-ákwá, were kwa iti-aka-n’obi, chigharikutem:

13 dọwa-kwa-nu obi-unu, adọwa-kwa-la uwe-unu, chigharikute Jehova, bú Chineke-unu: n’ihi na Onye-amara na Onye-obi ebere ka Ọ bu, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Nke nāba kwa uba n’ebere, Ọ nēcheghari kwa uche bayere ihe ọjọ ahu Ọ gēweta.

14 Ònye mara? eleghi anya O gēchighari, chègharia uche, me ka ngọzi fọdu n’azu Ya; bú onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu inye Jehova, bú Chineke-unu.

15 Fùanu opì-ike nime Zaion, donu obubu-ọnu nsọ, kpọsanu ubọchi nb͕ochi:

16 menu ka ndi Israel zukọta, donu nkpọkọta Israel nsọ, chikọtanu ndi-okenye, menu ka umu-ntakiri na ndi nāṅu ara zukọta: ka onye nālu nwunye ọhu si n’ime-ulo-ya puta, ka nwunye ọhu si kwa n’ulo-ndina-ya puta.

17 Ka ndi-nchu-àjà, bú ndi nējere Jehova ozi, kwa ákwá n’etiti uzọ-nbata-Ya na ebe-ichu-àjà-Ya, si, Jehova, mere ndi-Gi ebere, arara-kwa-la ihe-nketa-Gi nye n’ita-uta, Ka mba nile ọzọ we ghara ichi ha: n’ìhi gini ka ha gāsi n’etiti ndi nile dí iche iche, Òle ebe Chineke-ha nọ?

18 Jehova we kwo ekworo ala-Ya, nwe ọmiko n’aru ndi-Ya.

19 Jehova we za, si ndi-Ya, Le, M’ganēzitere unu ọka-unu na manya-vine ọhu unu na manu ọhu unu, afọ ya ewe ju unu: M’gaghi-eme kwa unu ihe-ita-uta ọzọ n’etiti mba nile:

20 ma M’gēme ka usu-ndi-agha Ugwu ahu si n’aru-unu je n’ebe di anya, M’gāchubà kwa ya n’ala kpọrọ nku na ebe tọb͕ọrọ n’efu, iru-ya n’oké osimiri Iru-anyanwu, na nsọtu-Ya n’oké osimiri Ọdida-anyanwu; ísì ọjọ ya gārigo kwa, e, ísì-ya nke jọb͕uru onwe-ya gārigo, n’ihi na o mewo onwe-Ya uku n’ime ihe.

21 Atula egwu, gi ala, te egwú ọṅù, ṅuri kwa; n’ihi na Jehova emewo Onwe-ya uku n’ime ihe.

22 Unu atula egwu, unu anu ọhia; n’ihi na ebe-ita-nri nile nke ọzara nēpuputa ahihia ndu, n’ihi na osisi nāmi nkpuru-ya, osisi fig na osisi vine nāmi nkpuru ka ike-ha ra.

23 Umu Zaion, teghari-kwa-nu egwú ọṅù, ṅuri kwa na Jehova, bú Chineke-unu: n’ihi na Ọ nēnye unu miri-ozuzo mbu ka ezi omume-Ya si di, me kwa ka oké miri-ozuzo zodatara unu, bú miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu, n’ọnwa mbu.

24 Ebe-nzọcha-ọka nile gējuputa kwa n’ọka wheat, ebe-inara-manya-vine na manu gērubiga kwa na manya-vine ọhu na manu ọhu.

25 M’gākwughachi kwa unu arọ nile nke igurube na ukpala na ọbubu na palmer-worm riworo, bú oké usu-ndi-agham nke M’zitere n’etiti unu.

26 Unu gēriju afọ, afọ ewe ju unu, unu ewe to aha Jehova, bú Chineke-unu, Onye mesoworo unu n’ilu oké ọlu: ihere agaghi-eme kwa ndim rue mb͕e ebighi-ebi.

27 Unu gāma kwa na n’etiti Israel ka M’nọ, na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, na ọ dighi onye ọzọ: ihere agaghi-eme kwa ndim rue mb͕e abighi-ebi.

28 O gēru kwa ma emesia, na M’gāwusa Mọm n’aru anu-aru nile, bú madu; umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma, ndi-okenye-unu gārọ nrọ, umu-okorọbia-unu gāhu ọhù:

29 e, ọbuná n’aru ndi-orù ndikom na n’aru ndinyom nēje ozi ka M’gāwusa Mọm na mb͕e ahu.

30 M’gēnye kwa ihe-ebube di iche iche n’elu-igwe na n’uwa: ọbara, na ọku, na ogidi nke anwuru-ọku.

31 Anyanwu gāb͕anwe ghọ ọchichiri, ọnwa gāb͕anwe kwa ghọ ọbara, tutu ubọchi Jehova abia, bú ubọchi ahu di uku di kwa egwu.

32 Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke gākpọku aha Jehova, agēme ka o wepuga onwe-ya: n’ihi na n’ugwu Zaion na nime Jerusalem ka ufọdu ndi b͕apuru ab͕apu gādi, dika Jehova siworo, na n’etiti ndi fọduru afọdu ka ndi Jehova nākpọ gādi.

Categories
JOEL

JOEL 3

1 N’ihi na, le, na mb͕e ahu na n’oge ahu, mb͕e M’gēme ka ndi Juda na Jerusalem adọtara n’agha lata,

2 M’gāchikọta mba nile, me ka ha rida na ndagwurugwu Jehoshafat; Mu na ha gēkpe kwa ikpe n’ebe ahu bayere ndim na ihe-nketam, bú Israel, ndi ha chusaworo n’etiti mba nile, ọ bu kwa alam ka ha kère.

3 Ọ bu kwa ndim ka ha fetaworo na nzà: ha we nye nwa-okoro iji b͕anwe nwanyi nākwa iko, nwa-mb͕ọ ka ha re-kwa-ra n’ihi manya-vine, ka ha we ṅua.

4 Ọzọ kwa, gini ka unu gēmem, unu Taia na Zaidon na buruburu-ala nile nke Filistia? Ọ̀ di nmeso M’mesoworo unu unu onwe-unu nākwughachim, ma ọ̀ bu na ihe di unu onwe-unu nēmesom? M’gēji ngwa na ọsọ nyeghachi nmeso-unu n’isi-unu.

5 Ebe ọ bu ọla-ọcham na ọla-edom ka unu wereworo, ebe ọ bu kwa ezi ihem nile anāchọsi ike ka unu chibàworo n’ulo uku nile unu;

6 ebe ọ bu kwa umu Juda na umu Jerusalem ka unu nēre nye umu ndi Jevan, ka unu we me ka ha si n’ókè-ala-ha je n’ebe di anya:

7 le, M’gaje isi n’ebe ahu ebe unu nērega ha-ri kpọte ha, nyeghachi nmesò-unu n’isi-unu;

8 M’gēre kwa umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom nye n’aka umu Juda, ha ewe re ha nye ndi Sheba, bú mba di anya: n’ihi na Jehova ekwuwo.

9 Kpọsanu nka n’etiti mba nile; donu agha nsọ: kpọtenu ndi-dike; ka ndi-agha nile biarue nso, rigota.

10 Kpugharianu mma-ọgè-unu ka ha buru mma-agha, na mma-ikwa-osisi-unu ka ha buru ube: ka onye-ume-ngwu si, Dike ka m’bu.

11 Menu ngwa, bia, unu mba nile ndi bi buruburu, chikọtanu onwe-unu: Jehova, me ka ndi-dike-Gi rida n’ebe ahu.

12 Ka mba nile teta, rigota na ndagwurugwu Jehoshafat: n’ihi na n’ebe ahu ka M’gānọdu ikpe mba nile bi buruburu ikpe.

13 Tiye mma-iwe-ihe-ubi, n’ihi na ihe agēwe n’ubi achawo: bianu, zọcha; n’ihi na ebe-nzọcha-nkpuru-vine ejuwo, ebe-inara-manya-vine nile erubigawo; n’ihi na ihe ọjọ ha bara uba.

14 Ọtutu ìgwè madu, ọtutu ìgwè madu nime ndagwurugwu nkpebì-ikpe! n’ihi na ubọchi Jehova di nso nime ndagwurugwu nkpebì-ikpe.

15 Anyanwu na ọnwa ejiwo nji, kpakpando achikọpuwo kwa onwunwu-ha.

16 Jehova gēsi kwa na Zaion bib͕ọ, me ka olu-Ya si na Jerusalem da; elu-igwe na uwa gēme kwa nkpatu: ma Jehova gāburu ndi-Ya ebe-nb͕abà, Ọ gābu-kwa-ra umu Israel ebe siri ike.

17 Unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Onye bi na Zaion, bú ugwu nsọm: Jerusalem ewe di nsọ, ndi ala ọzọ agaghi-agabiga kwa nime ya ọzọ.

18 Ọ gēru kwa n’ubochi ahu, na ugwu nile ganābusa manya-vine utọ, miri-ara ganērù kwa n’ugwu ntà nile, miri ganērù kwa n’ebe nile nke Juda miri si erù; isi-iyi gēsi kwa n’ulo Jehova puta, de ndagwurugwu Shitim.

19 Ijipt gāghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu, Edom gāghọ kwa ọzara, bú ebe tọb͕ọrọ n’efu, n’ihi ihe-ike emere umu Juda, n’ihi na ha awusiwo ọbara nēmeghi ihe ọjọ n’ala-ha.

20 Ma Juda gābu ebe madu bi rue mb͕e ebighi-ebi, Jerusalem kwa rue ọb͕ọ na ọb͕ọ.

21 M’gāgu kwa ọbara-ha n’ihe ikpe nāmaghi, bú nke M’nāgughi ya n’ihe ikpe nāmagh: n’ihi na Jehova nēbi nime Zaion.

Categories
EMOS

EMOS 1

1 Okwu Emos, onye nọ n’etiti ndi-nche-anu-ulo nke Tekoa, nke ọ huru bayere Israel n’ubọchi Uzaia, bú eze Juda, na n’ubọchi Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel, arọ abua tutu ala-ọma-jijiji.

2 Ọ we si, Jehova gēsi na Zaion bib͕ọ, me ka olu-Ya si na Jerusalem da; ebe-ita-nri nile nke ndi-ọzùzù-aturu ewe ru újú, elu Kamel gākpọnwu kwa.

3 Otú a ka Jehova siri: N’ihi njehie atọ nke Damaskọs, e, n’ihi anọ, ka M’nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n’ihi na ha ewerewo ígwè eji azọcha ọka zọcha Gilead:

4 ma M’gēzite ọku n’ulo Hazael, ọ gēripia kwa ulo-elu nile nke Ben-hedad.

5 M’gētiji kwa nkpọrọ Damaskọs, si na ndagwurugwu Even bipu onye bi ya, si kwa n’ulo Eden bipu onye nējide nkpa-n’aka-eze: agēme kwa ka ndi Siria je biri n’ala ọzọ, bú Kia; otú a ka Jehova siri.

6 Otú a ka Jehova siri: N’ihi njehie atọ nke Geza, e, n’ihi anọ, ka M’nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n’ihi na ha mere ka otù ndi je biri n’ala ọzọ, ha nile, imechibido ha nye n’aka Edom:

7 ma M’gēzite ọku n’elu mb͕idi Geza, ọ gēripia kwa ulo-elu-ya nile:

8 M’gēsi kwa n’Ashdad bipu onye bi ya, si kwa n’Ashkelon bipu onye nējide nkpa-n’aka-eze; M’gēchighari kwa akam imegide Ekron, ndi Filistia ndi fọduru gāla kwa n’iyì; otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri.

9 Otú a ka Jehova siri: N’ihi njehie atọ nke Taia, e, n’ihi anọ ka M’nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n’ihi na ha mechibidoro otù ndi emere ka ha nile je biri n’ala ọzọ nye n’aka Edom, ha echetaghi kwa ọb͕ub͕a-ndu nke umu-nne:

10 ma M’gēzite ọku n’elu mb͕idi Taia, o gēripia kwa ulo-elu-ya nile.

11 Otú a ka Jehova siri: N’ihi njehie atọ nke Edom, e, n’ihi anọ, ka M’nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n’ihi na o jiri mma-agha chu nwa-nne-ya, o bibi-kwa-ra obi-ebere-ya nile, iwe-ya we nādọka rue mb͕e ebighi-ebi, ma nrubiga-ókè nke iwe-Ya, o debewo ya mb͕e ebighi-ebi:

12 ma M’gēzite ọku na Timan, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Bọzra.

13 Otú a ka Jehova siri: N’ihi njehie atọ nke umu Amon, e, n’ihi anọ, ka M’nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi; n’ihi na ha ab͕awawo ndinyom Gilead di ime afọ ka ha we me ka ókè-ala-ha sa mbara:

14 ma M’gēsuye ọku na mb͕idi Raba, ọ gēripia kwa ulo-elu-ya nile, n’iti-nkpu agha n’ubọchi agha, n’oké ifufe n’ubọchi oké ikuku:

15 eze-ha gāla kwa n’etiti ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, ya onwe-ya na ndi-isi-ya n’otù; otú a ka Jehova siri.