Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 46

1 Okwu Jehova nke ruru Jeremaia, bú onye-amuma, nti bayere mba nile.

2 Nke diri Ijipt: bayere usu-ndi-agha nke Fero-neko, bú eze Ijipt, nke di n’akuku osimiri Yufretis nime Kakemish, nke Nebukadreza, bú eze Babilon, tib͕uru n’arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda.

3 Donu ọta na ọta uku n’usoro, biaru-kwa-nu nso ibu agha.

4 Kegidenu inyinya n’ub͕ọ-ala, rikwasinu, unu ndi-inyinya, guzo-kwa-nu onwe-unu nēkpu okpu-agha; richanu ube-unu, yirinu uwe-agha-unu.

5 Gini mere m’huworo ya? ndi ahu nātu ujọ b͕aghachi azu; anētipia kwa ndi-dike-ya, ha ab͕alagawo kwa ngwa ngwa, we ghara ile anya n’azu: egwu di buruburu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

6 Ka onye nwere ukwu ọsọ ghara ib͕alaga, ka dike ghara kwa iwepuga onwe-ya; n’Ugwu n’akuku osimiri Yufretis ka ha suru ngọngọ, da.

7 Ònye bu onye a? dika osimiri Nail ka ọ nērú, dika osimiri ka miri-ya nile nāmaghari.

8 Ijipt nērú dika osimiri Nail, ọ bu kwa dika osimiri ka miri-ya n’amaghari: o we si, M’gārigo, kpuchie uwa; m’gēme ka obodo na ndi bi nime ya la n’iyì.

9 Rigonu, unu inyinya; kpọtuanu nkpọtu, unu ub͕ọ-ala; ka ndi-dike puta kwa: Kush na Put, ndi nēji ọta; na Ludim, ndi nēji nāzọ kwa uta ukwu ikwe ya.

10 Ma ubọchi ahu diri Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ bu ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀, ka O we bọ̀rọ Onwe-ya ndi nēmegide Ya ọ́bọ̀: mma-agha gēripia kwa, afọ eju kwa ya, ọ gāṅuju kwa ọbara-ha afọ: n’ihi na àjà ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwere n’ala Ugwu n’akuku osimiri Yufretis.

11 Rigorue Gilead, nara balm, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Ijipt: n’efu ka i meworo ka ọgwu ba uba; ọ dighi ọgwu-ntechi i nwere.

12 Mba nile anuwo ihere-gi, iti-nkpu-gi juputa-kwa-ra uwa: n’ihi na dike asukwasiwo dike ngọngọ, n’otù ka ha dakọworo, ha abua.

13 Okwu ahu nke Jehova gwara Jeremaia, bú onye-amuma, bayere ọbibia nke Nebukadreza, bú eze Babilon, itib͕u ala Ijipt.

14 Gosinu n’Ijipt, menu ka anuru ya na Migdol, me-kwa-nu ka anuru nime Nof na nime Tahpanhes: sinu, Guzo onwe-gi, dozi-kwa-ra onwe-gi; n’ihi na mma-agha eripiawo buruburu gi.

15 Gini mere eji zachapu onye nke gi di ebube? o guzoghi, n’ihi na Jehova kwaturu ya.

16 O mere ka ndi nāsu ngọngọ di ọtutu, e, otù onye dakwasiri ibe-ya: ha we si, Bilie, ka ayi laghachikuru ndi-ayi, laghachi kwa n’ala amuru ayi, pua n’iru mma-agha nēme ihe-ike.

17 Ha kpọrọ nkpu n’ebe ahu, si, Fero, bú eze Ijipt, bu nání nkpọtu; o kwerewo ka mb͕e akara àkà gabiga.

18 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n’ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya), n’ezie dika Teboa n’etiti ugwu nile, na dika Kamel n’akuku oké osimiri, otú a ka ọ gābia.

19 Mere onwe-gi ihe nile iji je biri n’ala ọzọ, gi ada nēbi n’Ijipt: n’ihi na Nof gāghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu, esuresiwo kwa ya ọku, o we ghara inwe onye-obibi.

20 Nwa-ab͕ọghọ-ehi mara nma nke-uku ka Ijipt bu; odudo nke sitere n’Ugwu abiawo, ọ biawo.

21 Ọzọ, ndi-ya egoro agha ndi nọ n’etiti ya di ka umu-ehi nke ulo ebe anēme ka anu ma abuba; n’ihi na ha onwe-ha elewo anya n’azu, ha ab͕alagawo n’otù, ha eguzogh: n’ihi na ubọchi nhuju-anya-ha abiakwasiwo ha, bú mb͕e nleta-ha.

22 Olu-ya di ka mkpatu agwọ mb͕e ọ nāga; n’ihi na ha gāchiri usu-ndi-agha je ije, ha achiriwo kwa anyu-ike biakute ya, dika ndi-ọwa-nkú.

23 Ha gēb͕utu oké ọhia-ya, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), n’ihi na agaghi-eleputa ya; n’ihi na ha di ọtutu kari igurube, ha adighi kwa ọnu-ọgugu.

24 Agēme ka ihere me ada Ijipt; agēnye ya n’aka ndi Ugwu.

25 Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M’gaje iji nmehie-ha leta Amon nke No, leta kwa Fero, leta kwa Ijipt, leta kwa chi-ya nile, leta kwa ndi-eze-ya; ọbuná Fero, na ndi nātukwasi ya obi:

26 M’gēnye kwa ha n’aka ndi nāchọ ndu-ha, na n’aka Nebukadreza, bú eze Babilon, na n’aka ndi-orù-ya: ma emesia agēbi ya, dika o si di n’ubọchi nile nke mb͕e ochie; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

27 Ma gi onwe-gi, atula egwu, gi orùm, bú Jekob, atu-kwa-la ujọ, gi Israel: n’ihi na, le, M’gaje izọputa gi n’ebe di anya, zọputa kwa nkpuru-gi n’ala ọzọ ebe emere ka ha je biri; Jekob gālata kwa, nọ jū n’aru mgbū, ọ dighi kwa onye ganēme ka ọ ma jijiji.

28 Gi onwe-gi atula egwu, gi orùm, bú Jekob, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); n’ihi na gi ka M’nọyere: n’ihi na M’gēme ka mba nile gwusia, bú ebe M’chugaworo gi, ma gi ka M’nāgaghi-eme ka i gwusia: ma M’gādọ gi aka na nti n’ikpé, M’gaghi-asi kwa na i bu onye ikpe nāmaghi ma-ọli.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 47

1 Okwu Jehova nke ruru Jeremaia, bú onye-amuma, nti bayere ndi Filistia, tutu Fero etib͕ue Geza.

2 Otú a ka Jehova siri: Le, miri nēsi n’Ugwu erú, ha gāghọ kwa miri-iyi nērubiga ókè, ha gērusa kwa ala na ùjú-ya, na obodo na ndi bi nime ya: madu ewe tie nkpu, ndi nile bi n’ala ahu gākwasi kwa ákwá ike.

3 Site n’olu ọzuzọ nke ukwu inyinya-ya nile di ebube, site na nkpọtu ub͕ọ-ala-ya, na ùzù nke wheel-ya nile, ndi bu nna eleghi anya n’azu ilekwasi umu-ha n’ihi aka kudara akuda;

4 n’ihi ubọchi ahu nke nābia ipunara ndi Filistia nile ihe-ha, ibipu na Taia na ibipu na Zaidon onye-iye-aka ọ bula nke fọduru: n’ihi na Jehova nāpunara ndi Filistia ihe, bú ndi agwe-etiti Kaftoa fọduru.

5 Nkwọcha-isi abiakwasiwo Geza; emewo ka Ashkelon dere du, bú ndi ndagwurugwu-ha fọduru: rùe ole mb͕e ka i gēbì onwe-gi mma?

6 A, gi mma-agha Jehova nwere, rùe ole mb͕e ka i gāghara idi jū? miye onwe-gi n’ọbọ-gi; doro aru ala, dere du.

7 Ì gesi aṅa di jū, ebe Jehova nyeworo gi iwu? imegide Ashkelon, na imegide ọnu-miri nke oké osimiri, n’ebe ahu ka Ọ kaworo ya.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 48

1 Nke diri Moab. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ahuhu diri Nebo! n’ihi na emebiwo ya; emewo ka ihere me Kiriataim, ewerewo ya: emewo ka ihere me Misgab, ọ nātu kwa ujọ.

2 Ọ dighi kwa otuto Moab di ọzọ; nime Heshbon ka ha chèputara èchìchè ọjọ megide ya, si, Bianu, ka ayi bipu ya ka ọ ghara ibu mba. Gi Madmen, agēme kwa ka i dere du; gi ka mma-agha gējeso.

3 Ge nti olu iti-nkpu nke siri na Horonaim puta, ọ bu ipunara-madu-ihe na ntikpọ uku!

4 Etikpọwo Moab; ndi-ntà-ya emewo ka anuru iti-nkpu.

5 N’ihi na nrigo Luhit ka o ji ikwa-ákwá nārigo nākwa ákwá; n’ihi na nime nrida Horonaim ka ha nuworo nkpà nke iti-nkpu nke ntikpọ.

6 B͕alaganu, wepuganu onwe-unu, di-kwa-nu ka osisi tamarisk n’ọzara.

7 N’ihi na ọ bu n’ihi na i tukwasiwo obi-gi n’ọlu-gi nile na n’àkù-gi nile ka agēwere kwa gi onwe-gi: Kemosh gāpu kwa so ndi gēje biri n’ala ọzọ, na ndi-nchu-àjà-ya na ndi-isi-ya n’otù.

8 Onye nāpunara madu ihe gābiaru kwa obodo nile ọ bula, ọ dighi kwa obodo ọ bula gēwepuga onwe-ya; ndagwurugwu gāla kwa n’iyì, agēme kwa ka ala di lari tọb͕ọrọ n’efu; dika Jehova siri.

9 Nyenu Moab nkù, n’ihi na ọ ghaghi ifepu efepu: obodo-ya nile gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n’efu, ghara inwe onye bi nime ha.

10 Onye anābu ọnu ka onye nke ji aghughọ eje ozi Jehova bu, onye anābu ọnu ka onye nke nēb͕opu mma-agha-ya n’ọbara bu kwa.

11 Onye nānọ jū ka Moab bu site na mb͕e ọ di na nwata, ọzọ, manya-vine doro edo ka ọ bu, esighi kwa n’otù ihe b͕aye ya n’ihe ọzọ, o jeghi kwa n’etiti ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ: n’ihi nka ka utọ-ya guzoworo nime ya, ísì-ya ab͕anweghi kwa.

12 N’ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), mb͕e M’gēzigara ya ndi nērulata ite manya-vine, ha ewe rulata ya; ọ bu kwa ihe manya-vine ya nile ka ha gāb͕apu, ọ bu kwa ite nile ha ka ha gātupia.

13 Ihere Kemosh gēme kwa Moab, dika ihere Bet-el, bú ihe-ntukwasi-obi-ha, mere ulo Israel.

14 Ùnu si aṅa si, Ndi-dike ka ayi bu, na ndi bu dìnkpà ibu agha?

15 Emebiwo Moab, obodo-ya nile akwugowo kwa n’anwuru-ọku umu-okorọbia-ya arọputara arọputa aridawo kwa n’ob͕ub͕u, ọ bu ihe si n’ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.

16 Nhuju-anya Moab di nso ibia, ihe ọjọ ya nēme kwa ngwa nke-uku.

17 Gosinu ya ebere unu nwere n’aru ya, unu ndi nile ndi nọ ya buruburu, na unu nile ndi mara aha-ya; sinu, Èsi aṅa b͕aji nkpa-n’aka di ike, bú ndele mara nma?

18 Si na nsọpuru-gi rida, nọdu ala n’akpiri-ikpọ-nku, gi ada nke bi na Dibon; n’ihi na onye nāpunara Moab ihe-ya arigowo imegide gi, o biliwo ebe-gi nile ewusiri ike.

19 Guzo n’uzọ, che nche, gi nwanyi bi n’Aroa: jua onye nāb͕alaga na nwanyi nke nēwepuga onwe-ya; si, Gini mere?

20 Emewo ka ihere me Moab; n’ihi na ọ tuwo ujọ: kwasie ákwá ike ti kwa nkpu; gosinu ya n’Anon, na emebiwo Moab.

21 Ikpé abiaruwo kwa ala nke bu ala di lari; rue Holon, ru kwa Jahza, ọ biakwasiwo kwa Mefaat;

22 biakwasi kwa Dibon, biakwasi kwa Nebo, biakwasi kwa Bet-diblataim;

23 biakwasi kwa Kiriataim, biakwasi kwa Bet-gamul, biakwasi kwa Bet-meon;

24 biakwasi kwa Keriot, biakwasi kwa Bọzra, biakwasi kwa obodo nile nke ala Moab, nke di anya ma-ọbu nke di nso.

25 Ebipuwo mpi Moab, ab͕ajiwo kwa ogwe-aka-ya, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta).

26 Menu ya ka ọ ṅubiga manya ókè; n’ihi na ọ bu Jehova ka o mere onwe-ya ka ọ di uku megide: Moab gāturu kwa onwe-ya n’ihe ọ b͕ọrọ, ọ gāghọ kwa ihe-ọchì, ọbuná ya onwe-ya.

27 N’ihi na Israel, ọ̀ bughi ihe-ọchì ọ buru gi? ọ̀ bu n’etiti ndi-ori ka achọtara ya? n’ihi na ka mb͕e ra i nēkwu okwu bayere ya, i nēfufe isi-gi.

28 Rapunu obodo nile, we biri na nkume di elu, unu ndi bi na Moab; di-kwa-nu ka nduru nke nālu akwu-ya n’ofè ọnu olùlù.

29 Ayi anuwo ihe bayere npako Moab, na ọ nāpako npako nke-uku; ọbuná ihe bayere idi-elu-ya, na npako-ya, na nganga-ya, na nbuli-elu nke obi-ya.

30 Mu onwem mara nrubiga-ókè-iwe-ya, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na ihe nēzighi ezi ka ọ bu; ekwukwu-ya nile, ihe nēzighi ezi ka ha meworo.

31 N’ihi nka ka m’gākwasiri Moab ákwá ike; e, ọ bu Moab nile ka m’gētiri nkpu: bayere ndi Kia-heres ka agātamu ntamu.

32 Ákwá nke kariri ákwá Jeza ka m’gākwara gi, gi osisi vine nke Sibma: alaka-gi nile gabigara oké osimiri, ọbuná n’oké osimiri nke Jeza ka ha ruru: n’elu nghọkọta-nkpuru-gi na n’elu nghọrọ-nkpuru-vine-gi ka onye nke nāpunara madu ihe daworo.

33 Ewepuwo kwa ọṅù na iteghari-egwú-ọṅù n’ubi ọma na n’ala Moab; emewokwam ka manya-vine kwusi n’ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile: ọ dighi onye gēji iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine zọcha nkpuru-vine; iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine agaghi-abu iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine.

34 Site n’iti-nkpu Heshbon rue Eleale, rue Jehez ka ha mere ka olu-ha da, site na Zoa rue Horonaim, rue Eglat-shelishiya: n’ihi na ọbuná miri Nimrim gāghọ nání ebe tọb͕ọrọ n’efu.

35 M’gēme kwa ka ọ kwusiri Moab, bú onye nēsure àjà-nsure-ọku n’ebe di elu, na onye nēsurere chi di iche ya ihe-nsure-ọku nesì ísì utọ; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

36 N’ihi nka obim nādara Moab udà dika ọ̀jà, obim nāda-kwa-ra ndi Kia-heres udà dika ọ̀jà: n’ihi nka ihe o nwebigara ókè nke o nwetara alawo n’iyì.

37 N’ihi na isi nile ọ bula kwọchara akwọcha, ọ bu kwa afu-ọnu nile ọ bula ka ebipuworo: n’aka nile ka obibì-mma dikwasi, n’úkwù nile ka ákwà-nkpe di kwa.

38 N’elu-ulo nile nke Moab na n’amá-ya nile, n’ebe nile ọ bula, ka iti-aka-n’obi di: n’ihi na etiwawom Moab dika ihe nātọghi utọ; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

39 Le ka esi tipia ya nke-uku! ha akwasiwo ákwá ike. Le ka Moab si b͕akuta azu n’ihere nke-uku! Moab aghọwo-kwa-ra ndi nile di ya buruburu ihe-ọchì na ihe-itu-ujọ.

40 N’ihi na otú a ka Jehova siri: Le, dika ugo ka ọ gēfesi ike, b͕asa nkù-ya abua rue Moab.

41 Ewerewo Keriot, anarawo kwa ebe nile ewusiri ike, obi ndi-dike Moab n’ubọchi ahu gādi kwa ka obi nwanyi ime nēme.

42 Agēkpochapu kwa Moab ka ọ ghara ibu otù ndi, n’ihi na ọ bu imegide Jehova ka ọ meworo onwe-ya ka ọ di uku.

43 Oké egwu na olùlù na ib͕udu nādikwasi gi, gi onye bi na Moab; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

44 Onye ahu nke nāb͕apu n’iru oké egwu ahu gādabà n’olùlù ahu; ọzọ, onye ahu nke nārigoputa n’òlùlù ahu, agējide ya n’ib͕udu ahu: n’ihi na M’gēme ka arọ nleta-ha biakute ya, bú Moab; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

45 N’okpuru ndò Heshbon ka ndi nāb͕alaga guzoworo nēnweghi ike: n’ihi na ọku esiwo na Heshbon pua, na ire-ọku site n’etiti Saihon, o we ripia akuku Moab, na opu-n’isi nke umu nkpọtu.

46 Ahuhu diri gi, Moab! ndi Kemosh alawo n’iyì: n’ihi na achiriwo umu-gi ndikom la na ndọta-n’agha, achiriwo kwa umu-gi ndinyom la na ndọta-n’agha.

47 Ma M’gēme ka ndi Moab adọtara n’agha laghachi n’ikpe-azu nke ubọchi nile; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta. Rue ebe a bu ikpé Moab.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 49

1 Nke diri umu Amon. Otú a ka Jehova siri: Ọ̀ dighi umu-ndikom Israel nwere? ọ̀ dighi onye-nnweta ihe-ya o nwere? Gini mere Malkam ji nweta Gad, ndi-ya we biri n’obodo-ya nile?

2 N’ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), mb͕e M’gēme ka anuru udà-opì agha rue Raba nke umu Amon; ọ gāghọ kwa obo ebe tọb͕ọrọ n’efu, ọ bu kwa umu-ya ndinyom ka agēji ọku sure: Israel ewe nweta ndi nwetara ya-ri; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

3 Kwasie ákwá ike, gi Heshbon, n’ihi na apunarawo Ai ihe-ya; tienu nkpu, unu umu-ndinyom nke Raba, kenu ákwà-nkpe n’úkwù: tienu aka n’obi, b͕aghari-kwa-nu n’ogige nile unu; n’ihi na Malkam gāla n’etiti ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, ya na ndi-nchu-àjà-ya na ndi-isi-ya n’otù.

4 Gini mere i ji ndagwurugwu nile anya isi? ndagwurugwu-gi nērùpu dika miri, gi ada nke nādaghachi azu, nke nātukwasi obi n’àkù-ya nile, si, Ònye gābiakutem?

5 Le, M’gaje ime ka oké egwu biakwasi gi, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta), site na ndi nile nọ gi buruburu; agāchupu kwa unu, onye ọ bula n’iru ya, ọ gaghi-adi kwa onye nāchikọta onye ọ bula nāwaghari.

6 Ma emesia M’gēme ka umu Amon adọtara n’agha laghachi; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

7 Nke diri Edom. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Amam-ihe, ọ̀ dighi kwa na Timan ọzọ? ndum-ọdu, ọ̀ lanariwo ndi-nghọta n’iyì? amam-ihe-ha, àwusiwo ya?

8 B͕alaganu, chigharia, biri n’ebe di omimi, unu ndi bi na Dedan; n’ihi na nhuju-anya Isọ ka M’gēme ka ọ biakwasi ya, mb͕e M’gēleta ya.

9 Ọ buru na ndi nāghọrọ nkpuru-vine abiakute gi, hà agaghi-aghọfọ nkpuru nke fọduru itutukọ? ọ buru na ndi-ori abia n’abali, hà agaghi-ebibi nke gēzuru ha?

10 N’ihi na Mu onwem ab͕abawo Isọ ọtọ, ekpughepuwom ebe-nzuzo-ya nile, ọ pughi kwa izobe onwe-ya: apunariwo nkpuru-ya na umu-nne-ya na ndi-ab͕ata-obi-ya ihe-ha, ọ dighi kwa ndu.

11 Rapu umu-nb͕ei-gi, Mu onwem gēdebe ha ndu; ka ndinyom-i di-ha nwuru tukwasim obi-ha.

12 N’ihi na otú a ka Jehova siri: Le, ndi anēkpeghi ikpe iṅu n’iko ahu aghaghi iṅu; ma gi onwe-gi, ì gābu kwa onye ahu nke anāmaghi ikpe ma-ọli? I gaghi-abu onye anāmaghi ikpe, n’ihi na i ghaghi iṅu.

13 N’ihi na Onwem ka M’jiri ṅu iyi, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na ihe-iju-anya na ihe-ita-uta na nkpọnkpọ ebe na ihe-nkọcha ka Bọzra gāghọ; obodo-ya nile gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe mb͕e ebighi-ebi.

14 Akukọ ka m’nuworo sitere na Jehova, ọ bu kwa ukọ̀ ka ezigaworo n’etiti mba nile, si, Chikọtanu onwe-unu, bia imegide ya, bili-kwa-nu ibu agha.

15 N’ihi na, le, mba di ntà ka M’meworo gi n’etiti mba nile, bú ihe-nlelì n’etiti madu.

16 Idi-egwu-gi, nganga nke obi-gi arafuwo gi, gi onye bi na nb͕awa nile nke nkume ahu di elu, onye nējide ebe di elu nke ugwu ntà: n’ihi na asi na i me akwu-gi ka ọ di elu dika nke ugo, M’gēme ka i si n’ebe ahu ridata; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

17 Edom gāghọ kwa ihe-iju-anya: o gēju onye ọ bula nke nāgabiga n’akuku ya anya, ọ gāma kwa ọsọ n’ihi ihe-otiti-ya nile.

18 Dika nkwatu nke Sọdọm na Gọmọra na ab͕ata nile ha, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ọ dighi onye ọ bula gēbi n’ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya.

19 Le, dika ọdum ka ọ nārigo, bú nke si na nbili-elu nke Jọdan arigo, rue ebeita-nri nādigide mb͕e nile: ma n’otù ntabi-anya ka M’gēme ka o si n’aru-ya b͕a ọsọ; ma ònye bu onye arọputara arọputa? onye-nlekọta-ya ka M’gēme ya: n’ihi na ònye di kam? ọ̀ bu kwa onye gākaram mb͕e? ma-ọbu ònye bu kwa onye-ọzùzù-aturu a nke gēguzo n’irum?

20 N’ihi nka nurunu ndum-ọdu Jehova, nke Ọ duworo megide Edom; na èchìchè-Ya nile, nke O chèworo megide ndi bi na Timan, si: N’ezie ha gādọkpupu ha, bú ndi ntà nke ìgwè ewu na aturu; n’ezie o gēju ebe-ita-nri-ha anya bayere ha.

21 Site n’olu nke ọdida-ha uwa mara jijiji; iti-nkpu di, n’Oké Osimiri Uhie ka anuru olu-ya.

22 Le, dika ugo ka ọ gārigo, fesie ike, b͕asa nkù-ya n’elu Bọzra: obi ndi-dike Edom n’ubọchi ahu gādi kwa ka obi nwanyi ime nēme.

23 Nke diri Damaskọs. Ihere emewo Hemat na Apad; n’ihi na akukọ ọjọ ka ha nuworo, ha ab͕azewo: n’oké osimiri ka ncheb͕u di; ọ pughi inọ jū.

24 Damaskọs aghọwọ onye-ume-ngwu, o lewo anya n’azu ib͕alaga, ọma-jijiji ejidewo kwa ya: nkpà na ihe-nb͕u di iche iche ejidesiwo kwa ya ike, dika nke nwanyi ime nēme.

25 Èsi aṅa ghara irapu obodo nke otuto, bú obodo nke obi-utọm?

26 N’ihi nka ka umu-okorọbia-ya gāda n’amá-ya nile, ọ bu kwa ndi-agha-ya nile ka agēme ka ha dere du n’ubọchi ahu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

27 M’gēsuye kwa ọku na mb͕idi Damaskọs, ọ gēripia kwa ulo nile di elu nke Ben-hedad.

28 Nke diri Kida, di-kwa-ra ala-eze nile nke Hezoa, nke Nebukadreza, bú eze Babilon, tib͕uru.

Otú a ka Jehova siri: Bilienu, rigorue Kida, punara umu Iru-anyanwu ihe-ha.

29 Ulo-ikwū nile ha na ìgwè ewu na aturu-ha ka ha gāchiri; ákwà-nkwuba nile ha na ihe nile ha na camel nile ha ka ha gēbupuru onwe-ha: ha gākpọ nkpu bayere ha, si, Ujọ di buruburu.

30 B͕alaganu, wagharia nke-uku, biri n’ebe di omimi, unu ndi bi na Hezoa, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); n’ihi na Nebukadreza, bú eze Babilon, aduwo ọdu megide unu, ọ chèwo kwa èchìchè megide unu.

31 Bilienu, rigorue mba nke nọ n’udo, nke bi na ntukwasi-obi, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); nke nēnweghi ọnu-uzọ ma-ọbu ihe-ntuchi, nání ha nēbi.

32 Camel nile ha gāghọ kwa ihe-nluta-n’agha, ìgwè anumanu-ha gāghọ kwa ihe-nkwata: M’gēfesa-kwa-ra ifufe nile ndi akọpuworo usọ isi-ha; ọ bu kwa n’ofè-ya nile ka M’gēme ka nhuju-anya-ha si bia; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

33 Hezoa gāghọ kwa ebe-obibi nkita-ọhia, bú ebe tọb͕ọrọ n’efu rue mb͕e ebighi-ebi: ọ dighi onye ọ bula gēbi n’ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya.

34 Okwu Jehova nke ruru Jeremaia, bú onye-amuma, nti bayere Ilam na mb͕e mbu nke ọbubu-eze nke Zedekaia, bú eze Juda, si,

35 Otú a ka Jehova nke usu nile ndi-agha siri: Le, M’gaje ib͕aji uta Ilam, bú isi ihe nke idi-ike-ha.

36 M’gēme kwa ka ifufe anọ si na nsọtu anọ nke elu-igwe biakute Ilam, M’gēfesa kwa ha nye ifufe nile ndia; ọ gaghi-adi kwa mba ọ bula ebe ndi Ilam achugara achuga nāgaghi-abà.

37 M’gēme kwa ka Ilam tua ujọ n’iru ndi-iro-ha na n’iru ndi nāchọ ndu-ha: M’gēme kwa ka ihe ọjọ biakwasi ha, bú iwe di ọku nkem, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); M’gēziga kwa mma-agha n’azu ha, rue mb͕e M’mere ka ha gwusia:

38 M’gēdo kwa oche-eze nkem n’Ilam, M’gēme kwa ka eze na ndi-isi si n’ebe ahu la n’iyì; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

39 Ma o gēru, n’ikpe-azu nke ubọchi nile, na M’gēme ka ndi Ilam adọtara n’agha laghachi; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 50

1 Okwu ahu nke Jehova kwuru bayere Babilon, bayere ala ndi Kaldea, site n’aka Jeremaia, bú onye-amuma.

2 Gosinu n’etiti mba nile, menu ka anuru ya, bulienu ọkọlọtọ; menu ka anuru ya, unu ezobela: sinu, Ewerewo Babilon, emewo ka ihere mee Bel, Merodak atuwo ujọ; emewo ka ihere me arusi-ya nile akpuru akpu, arusi-ya nile atuwo ujọ.

3 N’ihi na otù mba esiwo n’Ugwu rigoputa imegide ya, mba ahu gēme ka ala-ya ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu, ọ dighi kwa onye ganēbi nime ya: ma madu ma anumanu, ha awaghariwo, la.

4 N’ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), umu Israel gābia, ha onwe-ha na umu Juda n’otù; ha ganēje ije nākwa ákwá, ọ bu kwa Jehova, bú Chineke-ha, ka ha gāchọ.

5 Ha gāju ajuju uzọ isi je Zaion, nēche iru-ha n’ebe a, si, Bianu, were onwe-unu rapara n’aru Jehova n’ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi nke anāgaghi-echezọ echezọ.

6 Ìgwè ewu na aturu nāla n’iyì ka ndim buworo: ndi-ọzùzù-aturu-ha emewo ka ha kpafue, n’ugwu di iche iche ka ha meworo ka ha laghachi azu: site n’ugwu rue ugwu ntà ka ha jeworo, ha echezọwo ebe-nmakpu-ha.

7 Ndi nile ndi nāchọputa ha eripiawo ha: ndi nākpab͕u ha siri, Ikpe amaghi ayi, n’ihi na ha emehiewo megide Jehova, bú ebe-obibi nke ezi omume, na olile-anya nke ndi bu nna-ha, bú Jehova.

8 Sinu n’etiti Babilon wagharia, si-kwa-nu n’ala ndi Kaldea pua, di-kwa-nu ka nkpi n’iru ìgwè ewu na aturu.

9 N’ihi na, le, Mu onwem gaje ikpọte me ka nkpọkọta mba uku di iche iche si n’ala Ugwu rigoputa imegide Babilon: ha gēdo kwa onwe-ha n’usoro megide ya; agēsi n’ebe ahu were ya: àkú nke usu ahu gādi ka nke dike nke bu ọ̀kà-uta; ọ gaghi-alaghachi azu n’efu.

10 Kaldea gāghọ kwa ihe-nkwata: afọ gēju ndi nile ndi nākwata ya; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

11 N’ihi na unu nāṅuri ọṅu, n’ihi na unu nāṅuri ọṅu-agha, unu ndi nāpunara ihe-nketam ihe, n’ihi na unu nāwuli elu dika nwa-ab͕ọghọ-ehi nke nāzọcha ọka, unu nēbe kwa dika inyinya di ike;

12 ihere gēme nne-unu nke-uku; nwanyi nke muru unu gēnwe iru-ihere: le, ọ gābu ọdudù mba nile, na ọzara, na ala kpọrọ nku, na ala ihe nādighi.

13 Site n’iwe Jehova madu agaghi-ebi nime ya, ma ọ gābusi ebe tọb͕ọrọ n’efu; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n’akuku Babilon anya, ọ gāma ọsọ n’ihi ihe-otiti-ya nile.

14 Donu onwe-unu n’usoro imegide Babilon buruburu, unu ndi nile ndi nāzọ uta ukwu ikwe ya; b͕anu ya, unu asọlara àkú anya: n’ihi na Jehova ka o mehieworo megide.

15 Kpọnu nkpu-agha megide ya buruburu; o kweyewo ekweye; ihe-nkwagide-ya nile adawo, etikpọwo kwa mb͕idi-ya nile: n’ihi na ibọ̀-ọ́bọ̀ Jehova ka ọ bu: bọ̀nu ya ọ́bọ̀; dika ọ meworo, menu ya otú a.

16 Bipunu ọgha-nkpuru nime Babilon, ya na onye nēji mma-iwe-ihe-ubi na mb͕e owuwe-ihe-ubi: n’iru mma-agha nēme ihe-ike ha gēche iru, onye ọ bula n’ebe ndi-ya nọ, ha gāb͕alaga kwa, onye ọ bula n’ala-ya.

17 Aturu nke emeworo ka ọ wagharia ka Israel bu; ọdum di iche iche achupuwo ya: ọdum nke-mbu, bú eze Asiria, ripiara ya; ma ọdum ikpe-azu a, bú Nebukadreza eze Babilon, ab͕ajiwo ọkpukpu-ya nile.

18 N’ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Le, M’gaje iji nmehie-ya leta eze Babilon, leta kwa ala-ya, dika M’jiworo nmehie eze Asiria leta ya.

19 M’gēme kwa ka Israel lata n’ebe-ita-nri-ya, ọ gāta kwa nri na Kamel na Beshan, ọ bu kwa n’ugwu Efraim na nime Gilead ka afọ gēju nkpuru-obi-ya.

20 N’ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), agāchọ ajọ omume Israel, ma ọ gaghi-adi; agāchọ kwa nmehie nile nke Juda, ma agaghi-achọta kwa ha: n’ihi na M’gāb͕aghara ndi M’nēme ka ha fọdu nmehie-ha.

21 Rigo megide ala Merataim, imegide ya, rigo kwa rue ndi bi na Pekod: b͕ue, wezuga kwa ka ebibie n’azu ha, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), me kwa dika ihe nile si di nke M’nyeworo gi n’iwu.

22 Olu agha di n’ala nka, na olu ntipia uku.

23 Le ka esiworo bipu otùtù nke uwa nile, b͕aji kwa ya nke-uku! le ka Babilon siworo ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu nke-uku n’etiti mba nile!

24 Esiworom i ọnyà, ọzọ kwa, amawo gi n’ọnyà ahu, gi Babilon, ma gi onwe-gi amagh: achọtawo gi, ọzọ kwa, ejidewo gi, n’ihi na Jehova ka i lusoworo ọ̀gù.

25 Jehova emeghewo ulo-àkù-Ya, chiputa ihe-agha nile nke oké iwe-Ya: n’ihi na ozi di nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nēje n’ala ndi Kaldea.

26 Sinu na nsọtu-ya biarue ya, meghenu ọba-ya nile: tulienu ya dika obo-ihe, wezuga-kwa-nu ya ka ebibie ya: ekwela ka ihe fọduru ya.

27 Gbuenu oke-ehi-ya nile; ka ha rida ka ewe b͕ue ha: ahuhu diri ha! n’ihi na ubọchi-ha abiawo, bú mb͕e nleta-ha.

28 Ge nti olu ndi nāb͕alaga, ndi nāb͕apu n’ala Babilon, igosi ibọ̀-ọ́bọ̀ nke Jehova, bú Chineke-ayi, na Zaion, bú ibọ̀-ọ́bọ̀ nke ulo uku Ya.

29 Menu ka ndi-ọb͕a-uta nuru izukọ imegide Babilon, bú ndi nile nāzọ uta ukwu ikwe ya; manu ulo-ikwū-unu imegide ya buruburu; ya ghara inwe ndi b͕apuru ab͕apu: kwughachinu ya ugwọ dika ọlu-ya si di; dika ihe nile si di nke o meworo, menu ya otú a: n’ihi na Jehova ka o meworo nganga megide, megide Onye Nsọ nke Israel.

30 N’ihi nka ka umu-okorọbia-ya gāda n’amá-ya nile, agēme kwa ka ndi-agha-ya nile dere du n’ubọchi ahu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

31 Le, Mu nēmegide gi, gi onye-nganga, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta): n’ihi na ubọchi-gi abiawo, bú mb͕e M’gēleta gi.

32 Onye-nganga gāsu kwa ngọngọ, da, ma ọ dighi onye ganēme ka o bilie: M’gēsuye kwa ọku n’obodo ya nile, o gēripia kwa ebe nile di ya buruburu.

33 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ndi emeb͕uru emeb͕u ka umu Israel na umu Juda bu n’otù: ndi nile dọtaworo ha n’agha ejidesiwo ha ike; ha ajuwo izilaga ha.

34 Onye-nb͕aputa-ha di ike; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya: Ọ gēkpezu ọnu-ha, ka O we me ka uwa doro aru ala, me kwa ka ndi bi na Babilon me nkpatu.

35 Mma-agha di n’aru ndi Kaldea, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na n’ebe ndi bi na Babilon nọ, na n’ebe ndi-isi-ya nọ, na n’ebe ndi-ya mara ihe nọ.

36 Mma-agha di n’ebe ndi-ekwukwu nọ, ha gāghọ ndi b͕agọrọ ab͕agọ n’uche-ha: mma-agha di n’ebe ndi-dike-ya nọ, ha gātu kwa ujọ.

37 Mma-agha di n’ebe inyinya-ya nile di, na n’ebe ub͕ọ-ala-ya di, na n’ebe ndi nile gwara ọgwa nọ, bú ndi nọ n’etiti ya, ha gāghọ kwa ndinyom: mma-agha di n’ebe àkù-ya nile di, agāluta kwa ha n’agha.

38 Ọkpukpọ-nku di n’ebe miri-ya nile di, ha gāta kwa ata: n’ihi na ala arusi di iche iche apiri api ka ọ bu, ha ji kwa ihe-egwu nile ha wi ara.

39 N’ihi nka ka anu-ọhia di iche iche nke bi n’ala kpọrọ nku gēbi n’ebe ahu, ha na anu-ọhia nke nēbe ebe, enyi-nnunu gēbi kwa n’ebe ahu: madu agaghi-ebi kwa nime ya ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi; ọ gaghi-abu kwa ebe-obibi rue ọb͕ọ nile.

40 Dika mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra na ab͕ata nile ha, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); otú a ọ dighi onye ọ bula gēbi n’ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya.

41 Le, otù ndi nēsi n’Ugwu bia; ọzọ, mba uku na ọtutu ndi-eze ka agākpọte site na nsọtu nile nke uwa.

42 Uta na ube ka ha nējide; mba di irè ka ha bu, ha adighi-enwe obi-ebere; olu-ha nēbib͕ọ dika oké osimiri, ọ bu kwa inyinya ka ha nānọkwasi; edoro mba ahu n’usoro, dika onye nēbu agha, imegide gi, ada Babilon.

43 Eze Babilon anuwo ùdé-ha, aka-ya abua we kuda: ihe-nb͕u ejidewo ya, ihe-nb͕ali dika nke nwanyi ime nēme.

44 Le, dika ọdum ka ọ nārigo, bú nke si na nbili-elu nke Jọdan arigo, rue ebe-ita-nri nādigide mb͕e nile: ma n’otù ntabi-anya ka M’gēme ka ha si n’aru ya b͕a ọsọ; ma ònye bu onye arọputara? onye-nlekọta-ya ka M’gēme ya: n’ihi na ònye di kam? ọ̀ bu kwa onye gākaram mb͕e? ma-ọbu ònye bu kwa onye-ọzùzù-aturu a nke gēguzo n’irum?

45 N’ihi nka nurunu ndum-ọdu Jehova, nke Ọ duworo megide Babilon; na èchìchè-Ya nile nke O chèworo megide ala ndi Kaldea, si: N’ezie ha gādọkpupu ha, bú ndi ntà nke ìgwè ewu na aturu: n’ezie ọ gēju ebe-ita-nri-ha anya bayere ha.

46 Site n’olu nke owuwe Babilon uwa mara jijiji, anuwo kwa iti-nkpu n’etiti mba nile.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 51

1 Otú a ka Jehova siri: Le, M’gaje ikpọte ifufe nke nēbibi ebibi megide Babilon, na n’ebe ndi bi na Leb-kamai nọ.

2 M’gēziga-kwa-ra Babilon ndi ala ọzọ, ndi gāfucha ya; ha gāwusi kwa ala-ya dika miri; n’ihi na ha nọ nēmegide ya buruburu n’ubọchi ihe ọjọ.

3 Ka okwe-uta kwe uta-ya n’ebe onye nēkwe uta nọ, na n’ebe onye nēweli onwe-ya elu n’uwe-agha-ya nọ: unu enwe-kwa-la ọmiko n’aru umu-okorọbia-ya; wezuganu usu-ndi-agha-ya nile ka ebibie ya.

4 Ha gāda kwa, buru ndi eb͕uru eb͕u, n’ala ndi Kaldea, na ndi adupuru adupú, n’èzí-ya nile.

5 N’ihi na Israel, ma-ọbu Juda, abughi nwanyi nke di-ya, bú Chineke-ya, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwuru anwu; ọ bu ezie na ala-ha juputara n’ikpe-ọmuma megide Onye Nsọ nke Israel.

6 Sinu n’etiti Babilon b͕alaga, wepuga-kwa-nu onwe-unu n’otù n’otù; unu ekwela ka eme unu ka unu dere du n’ajọ omume-ya: n’ihi na mb͕e ibọ̀-ọ́bọ̀ ka ọ buru Jehova; nmeso obodo ahu ka Ya onwe-ya nākwughachi ya.

7 Iko ọla-edo ka Babilon buworo n’aka Jehova, nke nēme ka uwa nile ṅubiga manya ókè: ufọdu nime manya-vine-ya ka mba di iche iche ṅuworo; n’ihi nka ka mba di iche iche nāwi ara.

8 Na mberede ka Babilon daworo, ewe tipia ya: kwasierenu ya ákwá ike; werenu balm bayere ihe-nb͕u-ya ma eleghi anya agāgwọta ya.

9 Ayi gāgwọtawori Babilon, ma agwọtaghi ya: rapunu ya, ka ayi la, onye ọ bula n’ala-ya: n’ihi na ikpé-ya erutuwo elu-igwe, ebuliwo kwa ya rue mbara-ígwé.

10 Jehova emewo ka ezi omume nile ayi puta: bianu, ka ayi kọ akukọ ọlu Jehova, bú Chineke-ayi, nime Zaion.

11 Muchanu àkú nile; jidesienu ọta nile ike: Jehova akpọtewo mọ nke ndi-eze Midia; n’ihi na imegide Babilon ka nzube-Ya di, ibibi ya: n’ihi na ibọ̀-ọ́bọ̀ Jehova ka ọ bu, bú ibọ̀-ọ́bọ̀ nke ulo uku Ya.

12 Bulienu ọkọlọtọ n’ebe mb͕idi nile nke Babilon di, menu ka nche sie ike, menu ka ndi-nche guzosie ike, dozienu uju nēru nbì; n’ihi na Jehova ezubewo me kwa ihe O kwuru megide ndi bi na Babilon.

13 Gi onye bi n’elu ọtutu miri, onye nwere ọtutu àkù, ọgwugwu-gi abiawo, bú ọtùtù nke urù-gi nēzighi ezi.

14 Jehova nke usu nile nke ndi-agha ejiwo Onwe-ya ṅu iyi, si, N’ezie M’gēmeju gi na madu, dika igurube; ha gēti kwa nkpu megide gi, bú nkpu nke nzọcha-nkpuru-vine.

15 Onye jiworo ike-Ya me uwa, Onye jiworo amam-ihe-Ya me ka elu-uwa dum madu bi guzosie ike, Onye jiworo nghọta-Ya setipu elu-igwe:

16 mb͕e Ọ nēme ka olu-Ya da, ùzù miri di n’elu-igwe, O we me ka alulu si na nsọtu uwa kwugo; O meworo miri-ozuzo àmùmà, Ọ nēme kwa ka ifufe si n’olu-nkwakọba-Ya nile puta.

17 Nání anu-ọhia ka madu ọ bula ghọworo site n’ihe-ọmuma-ya; emewo ka ihere me onye-nnucha-ọla ọ bula site n’arusi-ya apiri api: n’ihi na ugha ka arusi-ya awuru awu bu, nku-ume adighi kwa nime ha.

18 Ihe-efu ka ha bu, ọlu ikwa-emò: na mb͕e nleta-ha ha gāla n’iyì.

19 Ọ bughi dika ihe ndia ka òkè Jekob bu; n’ihi na onye nākpu ihe nile ka Ọ bu; Israel bu kwa ebo nke ihe-nketa-Ya: Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.

20 Anyu-ike-agha ka i burum na ihe-agham nile; ọ bu kwa gi ka M’gēji tipia mba di iche iche; ọ bu kwa gi ka M’gēji bibie ala-eze di iche iche;

21 ọ bu kwa gi ka M’gēji tipia inyinya na onye nānọkwasi ya; ọ bu kwa gi ka M’gēji tipia ub͕ọ-ala na onye nānọkwasi ya;

22 ọ bu kwa gi ka M’gēji tipia nwoke na nwanyi; ọ bu kwa gi ka M’gēji tipia agadi-nwoke na nwa-okoro; ọ bu kwa gi ka M’gēji tipia nwa-okorọbia na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke;

23 ọ bu kwa gi ka M’gēji tipia onye-ọzùzù-aturu na ìgwè aturu-ya; ọ bu kwa gi ka M’gēji tipia onye-ọlu-ubi na ehi-ya ejikọrọ abua abua; ọ bu kwa gi ka M’gēji tipia ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze.

24 M’gākwughachi kwa Babilon, kwughachi kwa ndi nile bi na Kaldea, ihe ọjọ nile ha nke ha meworo nime Zaion n’anya-unu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

25 Le, Mu nēmegide gi, gi ugwu nēbibi ebibi, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), nke nēbibi uwa nile: M’gēseti kwa akam imegide gi, kpọreda gi site na nkume-gi nile di elu, mee ka i ghọ ugwu esurere esure.

26 Ha agaghi-eweputa nime gi otù nkume ido na nkuku-ulo, ma-ọbu otù nkume itọ ntọ-ala; n’ihi na ebe nke tọb͕ọrọ n’efu mb͕e ebighi-ebi ka i gābu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

27 Bulienu ọkọlọtọ n’ala ahu, fùanu opì-ike n’etiti mba nile, donu mba di iche iche nsọ imegide ya, menu ka ala-eze, bú Ararat, na Mini, na Ashkenaz, nuru, zukọ imegide ya: menu ka otù ọchi-agha buru onye-nlekọta imegide ya; menu ka inyinya rigota dika igurube di egwu.

28 Donu mba di iche iche nsọ imegide ya, donu ndi-eze Midia, na ndi nāchi ala-ya, na ndi-ya nile nọchiri anya eze, na ala nile ọ nāchi, nsọ.

29 Ala ahu we nāma jijiji, nāb͕ali kwa: n’ihi na èchìchè nile nke Jehova megide Babilon eguzosiwo ike, ime ka ala Babilon ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu, ghara inwe onye-obibi.

30 Ndi-dike Babilon arapuwo ibu agha, ha nọduru n’ebe nile ha ewusiri ike; idi-ike-ha alasiwo; ha aghọwo ndinyom: ndi-iro-ha esuyewo ọku n’ebe-obibi-ya nile; etijiwo ihe-ntuchi-ya nile.

31 Otù ọb͕a-ọsọ gāb͕a ọsọ izute ọb͕a-ọsọ-ibe-ya, otù onye-ngosi gāb͕a kwa ọsọ izute onye-ngosi-ibe-ya, igosi eze Babilon na ewerewo obodo-ya na nsọtu-ya:

32 ọ bu kwa ngabiga-miri nile ka ewereworo, ọ bu kwa ọdọ-miri nile ka ha sureworo ọku, ndi-agha amawo kwa jijiji.

33 N’ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ada Babilon di ka ebe-nzọcha-ọka mb͕e anāzọcha ya; nwa mb͕e fọduru, mb͕e owuwe-ihe-ubi ewe biarue ya aru.

34 Nebukadreza, bú eze Babilon, eripiawom, o kpochapuwom, o mewom ka m’ghọ aria nke ihe nādighi, o lowom dika ogologo anu-miri, o mejuwo afọ-ya n’ihe-utọm nile, ọ chupuwom.

35 Ihe-ikem na nke anu-arum di n’isi Babilon, ka nwanyi nke bi na Zaion gāsi; ọzọ, Ọbaram di n’isi ndi bi na Kaldea, ka Jerusalem gāsi.

36 N’ihi nka ka Jehova ji si otú a: Le, M’gaje ikpe ọnu-gi, bọ̀ ọ́bọ̀-gi; M’gēme kwa ka oké osimiri-ya tasia, me kwa ka isi-iyi-ya takọrọ.

37 Babilon gāghọ kwa nání obo-ihe obo-ihe, ebe-obibi nkita-ọhia, na ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, ghara inwe onye-obibi.

38 N’otù ka ha gāb͕ọ uja dika umu-ọdum; ha edekpọwo dika umu-ọdum nāṅu ara.

39 N’okpom-ọku-ha ka M’gēme ọṅuṅu-manya nile ha, mee ka ha ṅubiga manya ókè, ka ha we ṅuria ọṅu-agha, raru ura ebighi-ebi, ghara iteta; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

40 M’gēme ka ha rida dika umu-aturu ka ewe b͕ue ha, dika ebulu, ha na nkpi.

41 Le, ka esiworo were Shishak! le, ka esiworo jide otuto uwa nile! le, ka Babilon siworo ghọ ihe-iju-anya n’etiti mba nile!

42 Oké osimiri erukpuwo Babilon: ejiwo nkpọtu nmali-miri-ya nile kpuchie ya.

43 Obodo-ya nile aghọwo ihe-iju-anya, na ala kpọrọ nku, na ala ihe nādighi, bú ala nke ọ nādighi onye ọ bula nēbi nime ha, nwa madu ọ bula adighi-agabiga kwa nime ha.

44 M’gēji kwa nmehie-ya leta Bel nime Babilon, M’gēme kwa ka ihe o loworo si n’ọnu-ya puta; mba di iche iche agaghi-erùkuru kwa ya ọzọ dika miri: ọzọ mb͕idi Babilon gāda.

45 Sinu n’etiti ya pua, unu ndim, wepuganu onwe-unu n’otù n’otù n’iwe di ọku nke Jehova.

46 Lezi-kwa-nu anya ka obi-unu ghara ilọ unu miri, ka unu ghara itu egwu n’ihi akukọ ahu nke anānu n’ala ahu; n’ihi na akukọ ahu gābia n’otù arọ, emesia n’arọ ọzọ akukọ ahu gābia kwa, ihe-ike gādi kwa n’ala ahu, onye nāchi achi nēmegide onye nāchi achi.

47 N’ihi nka, le, ubọchi nābia, mb͕e M’gēji nmehie-ha leta arusi nile apiri apiri nke Babilon, ihere gēme kwa ala-ya nile; ndi-ya nile eb͕uru eb͕u gāda kwa n’etiti ya.

48 Elu-igwe na uwa na ihe nile nke di nime ha ewe tie nkpu ọṅù bayere Babilon; n’ihi na ndi nāpunara ya ihe gēsi n’Ugwu biarue ya aru; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

49 Ọbuná Babilon aghaghi ida, unu ndi eb͕uru eb͕u nke Israel, ọ bu kwa na Babilon ka ndi ala ahu nile eb͕uru eb͕u gāda.

50 Unu ndi b͕apuworo na mma-agha, jenu, unu eguzola; chetanu Jehova site n’ebe di anya, ka Jerusalem bata kwa n’obi-unu.

51 Ihere emewo ayi, n’ihi na ayi anuwo ita-uta; ọnọdu-ihere etiyere ayi nime ya ekpuchiwo ayi n’iru: n’ihi na ndi ala ọzọ abàwo imegide ebe nsọ nile nke ulo Jehova.

52 N’ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), mb͕e M’gēji nmehie-ha leta arusi-ya nile apiri api; ọ bu kwa n’ala-ya nile ka ndi emeruworo aru gāsu udè.

53 Asi na Babilon arigorue elu-igwe, asi kwa na o wusie ebe di elu nke ike-ya ike, ma na Mu ka ndi nāpunara ya ihe gēsi biarue ya aru; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

54 Ge nti olu iti-nkpu sitere na Babilon, na olu ntipia uku sitere n’ala ndi Kaldea!

55 n’ihi na Jehova nāpunara Babilon ihe-ya, Ọ nēme kwa ka oké olu si nime ya la n’iyì; nmali-miri nile ha we bib͕ọ dika ọtutu miri, nkpọtu nke olu-ha akpọtuwo:

56 n’ihi na onye nāpunara ya ihe-ya ab͕iakwasiwo obodo ahu, bú Babilon, ejidewo kwa ndi-dike-ya, ab͕ajisiwo uta nile ha: n’ihi na Chineke nke nēmeso madu otú ha si eme ka Jehova bu, Ọ ghaghi ikwughachi.

57 M’gēme kwa ndi-isi-ya, na ndi-ya mara ihe, na ndi-ya nāchi ala, na ndi-ya nọchiri anya eze, na ndi-dike-ya, ka ha ṅubiga manya ókè; ha gāraru kwa ura ebighi-ebi, ghara iteta; ọ bu ihe si n’ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.

58 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Mb͕idi nile nke Babilon nke sara mbara, agēme ka ha ghọ ebe dasiri adasi, ọzọ, ọnu-uzọ-ama-ya nile nke di elu, agēji ọku sure ha; ndi nile di iche iche gādọb͕u kwa onwe-ha n’ọlu n’efu, mba di iche iche gādọb͕u onwe-ha n’ọlu itiye n’ọku: ike ewe gwu ha.

59 Okwu ahu nke Jeremaia, bú onye-amuma, nyere Seraia nwa Neraia, nwa Mahseia, n’iwu, mb͕e o soro Zedekaia, bú eze Juda, je Babilon n’arọ nke-anọ nke ọbubu-eze-ya. Ma Seraia bu onye-isi idozi ebe-izu-ike nke eze.

60 Jeremaia we de ihe ọjọ ahu nile nke gābiaru Babilon aru n’otù akwukwọ, bú okwu ndia nile nke edeworo bayere Babilon.

61 Jeremaia we si Seraia, Mb͕e i bàra na Babilon, gi le anya ka i gua okwu ndia nile,

62 si, Jehova, Gi onwe-gi ekwuwo okwu bayere ebe a ibipu ya, ka ihe ọ bula we ghara ibi nime ya, ma ọ bu madu ma-ọbu anumanu, n’ihi na ebe tọb͕ọrọ n’efu mb͕e ebighi-ebi ka ọ gābu.

63 Ọ gēru kwa, mb͕e i gubisiri akwukwọ a, na i gēkegide ya nkume, tubà ya n’etiti Yufretis:

64 i gāsi kwa, Otú a ka Babilon gēmikpu, ghara ibili ọzọ n’ihi ihe ọjọ ahu nke Mu onwem gaje ime ka ọ biakwasi ya: ike ewe gwu ha.

Rue ebe a bu okwu Jeremaia.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 52

1 Zedekaia b͕ara orú arọ na otù mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: aha nne-ya bu Hamutal nwa Jeremaia nke Libna.

2 O mee ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dika ihe nile si di nke Jehoiakim mere.

3 N’ihi na ọ bu n’ihi iwe Jehova ka ọ di otú a nime Jerusalem na Juda, rue mb͕e O siri n’iru Ya chupu ha: Zedekaia we nupu isi n’okpuru eze Babilon.

4 O rue, n’arọ nke-iteghete nke ọ bu eze, n’ọnwa nke-iri, n’ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, na Nebukadreza, bú eze Babilon, biara, ya onwe-ya na usu-ndi-agha-ya nile, imegide Jerusalem, ha we ma ulo-ikwū-ha megide ya; ha we wue ulo-agha imegide ya buruburu.

5 Ewe nānọchigide obodo ahu n’agha rue arọ nke-iri-na-otù nke eze, bú Zedekaia.

6 N’ọnwa nke-anọ, n’ubọchi nke-iteghete nke ọnwa ahu, oké unwu siri ike n’obodo ahu, ọ dighi kwa nri ndi ala ahu nwere.

7 Ewe tipue obodo, ndi-agha nile we b͕apu, pua n’obodo n’abali n’uzọ ọnu-uzọ-ama n’etiti mb͕idi-ya abua, nke di n’akuku ubi eze ab͕ara ogige; (ma ndi Kaldea nānọ imegide obodo buruburu:) ha we je n’uzọ Araba.

8 Usu-ndi-agha ndi Kaldea we chua eze n’azu, rue Zedekaia aru n’ala ihe nādighi nke Jeriko; ma usu-ndi-agha-ya nile siri n’ebe ọ nọ b͕asasia.

9 Ha we jide eze, me ka ọ rigokuru eze Babilon rue Ribla n’ala Hemat; o we kwue okwu ikpé n’ebe ọ nọ.

10 Eze Babilon we b͕ue umu-ndikom Zedekaia n’anya-ya, ọ bu kwa ndi-isi nile nke Juda ka o b͕uru na Ribla.

11 O me-kwa-ra ka Zedekaia kpue ìsì n’anya-ya abua; eze Babilon we were ihe-ọla eji ke ukwu ke ya ab͕u, me ka ọ ba na Babilon, tiye ya n’ulo-ndebe rue ubọchi ọnwu-ya.

12 Ma n’ọnwa nke-ise, n’ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, nke ahu bu arọ nke-iri-na-iteghete nke eze, bú Nebukadreza, eze Babilon, ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, onye guzoro n’iru eze Babilon, batara na Jerusalem:

13 o sure ulo Jehova ọku, na ulo eze; ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem, bú ulo uku ọ bula, ka o surere n’ọku.

14 Usu-ndi-agha nile nke ndi Kaldea, ndi soro onye-isi ndi-ob͕ū, kwatu-kwa-ra mb͕idi nile nke Jerusalem buruburu.

15 Ma ufọdu nime ndi Israel nēnweghi ike, na ndi Israel fọduru, bú ndi fọduru n’obodo, na ndi gbapuru agbapu, bú ndi gbapuru jekuru eze Babilon, na ndi fọduru n’etiti ìgwè madu, ndia ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha je biri n’ala ọzọ.

16 Ma ufọdu nime ndi ala ahu ndi nēnweghi ike ka Nebuzaradan, onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha fọdu ibu ndi-ọlu-ubi-vine na ibu ndi-ọlu-ubi.

17 Ma ogidi ọla nile nke di n’ulo Jehova, na ihe-ndọkwasi nile na oké osimiri ọla nke di n’ulo Jehova, ndia ka ndi Kaldea tipiara, chiri ọla-ha nile je Babilon.

18 Ite nile kwa, na osekè nile, na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ngaji nile, na ihe ọla nile nke ha ji eje ozi, ndia ka ha chipuru.

19 Ọkwa nile kwa, na ihe-igu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ite nile, na ihe-idọba-oriọna nile, na ngaji nile, na iko nile; ihe nke bu ọla-edo, n’ọla-edo, na ihe nke bu ọla-ọcha, n’ọla-ọcha, onye-isi ndi-ob͕ū chipuru ha.

20 Ogidi abua ahu, na otù oké osimiri ahu, na ehi iri na abua nke ọla nke di n’okpuru ihe-ndọkwasi-ya nile, nke eze, bú Solomon, mere nye ulo Jehova; ọ dighi ọtùtù atùru ọla ihe ndia nile.

21 Ma ogidi abua ahu, cubit iri na asatọ ka idi-elu otù ogidi di; ogho cubit iri na abua b͕a-kwa-ra ya buruburu; ib͕idi-ya di nkpisi-aka anọ: ọ di oghere n’ime-ya.

22 Isi nke di n’elu ya bu kwa ọla; idi-elu otù isi ahu di cubit ise; ihe-ọkpukpa na pomegranate di kwa n’isi ahu buruburu, ha nile bu ọla: ihe dika ndia ka ogidi nke-abua nwe-kwa-ra, ha na pomegranate.

23 Ma pomegranate ahu di ọgu anọ na iri na isi n’akuku ọ bula; pomegranate nile di ọgu ise n’elu ihe-ọkpukpa buruburu.

24 Onye-isi ndi-ob͕ū we chiri Seraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na Zefanaia, bú onye-nchu-àjà nke-abua, na ndi-nche atọ nke nbata-uzọ:

25 o si-kwa-ra n’obodo chiri otù onozi nke emeworo onye-nlekọta ndikom agha; na ndikom asa nime ndi nāhu iru eze, ndi achọtara n’obodo; na ode-akwukwọ, bú onye-isi usu-ndi-agha, onye nēme ka ndi ala ahu zukọta ibu agha; na ọgu ndikom atọ nime ndi ala ahu, ndi achọtaworo n’etiti obodo.

26 Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, we chiri ha, me ka ha jekuru eze Babilon, rue Ribla.

27 Eze Babilon we tib͕ue ha, me ka ha nwua na Ribla, n’ala Hemat. Ewe me ka Juda si n’ala-ya je biri n’ala ọzọ.

28 Nka bu ndi ahu nke Nebukadreza mere ka ha je biri n’ala ọzọ; n’arọ nke-asa nnù ndi-Ju asa na ọgu iri-na-otù na atọ:

29 n’arọ nke-iri-na-asatọ nke Nebukadreza ka o mere ka nnù madu abua na orú na iri na abua si na Jerusalem je biri n’ala ọzọ:

30 n’arọ nke-orú-na-atọ nke Nebukadreza ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ndi-Ju ufọdu, bú nnù madu na ọgu iri-na-asa na ise, je biri n’ala ọzọ: madu nile di nnù iri na otù na ọgu iri.

31 O rue, n’arọ nke-orú-na-iri-na-asa nke emere ka Jehoiakin, bú eze Juda, je biri n’ala ọzọ, n’ọnwa nke-iri-na-abua, n’ubọchi nke-orú-na-ise nke ọnwa ahu, na Evil-merodak, bú eze Babilon, n’arọ ọ malitere ibu eze, o weliri isi Jehoiakin, bú eze Juda, me ka o si n’ulo-nkpọrọ puta;

32 o we gwa ya okwu ọma, do oche-eze-ya elu kari oche-eze nke ndi-eze ndi ya na ha nọ na Babilon.

33 O we b͕anwe uwe nkpọrọ ya, o we nēri nri n’iru ya mb͕e nile ubọchi nile nke ndu-ya.

34 Anēnye kwa ya òkè-ihe-oriri-ya, bú òkè-ihe-oriri mb͕e nile, site n’aka eze Babilon, ihe nke ubọchi n’ubọchi-ya rue ubọchi ọnwu-ya, ubọchi nile nke ndu-ya.

Categories
ABÙ-ÁKWÁ

ABÙ-ÁKWÁ 1

1 Le, ka obodo ahu nke ndi-ya di ọtutu si nọdu ala nání ya!

Le, ka o siworo ghọ ihe di ka nwanyi di-ya nwuru!

Obodo nke riri nne n’etiti mba nile, nke bu isi n’etiti ala nile anāchi achi,

Le, ka o siworo ghọ usu ndi nēfè òfùfè.

2 Ọ nākwasi ákwá ike n’abali, anya-miri-ya di kwa na ǹtì-ya abua;

Ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere n’etiti ndi nile nāhu ya n’anya:

Ndi-eyì-ya nile aghọb͕uwo ya,

Ha aghọworo ya ndi-iro.

3 Juda ejewo ibiri n’ala ọzọ site na nweda-n’ala, na site n’iba-uba nke ọbubu-orù;

Ya onwe-ya ebiriwo n’etiti mba nile, ọ chọtaghi izu-ike:

Ndi nile ndi nāchu ya chukuru ya n’ebe di nkpà.

4 Uzọ nile nke Zaion nēru újú, n’ihi na ọ dighi ndi nābia na mb͕e akara àkà;

Ọnu-uzọ-ama-ya nile tọb͕ọrọ n’efu; ndi-nchu-àjà-ya nēze ume:

5 Ndi nākpab͕u ya aghọwo ndi-isi, ndi-iro-ya nọ n’udo;

N’ihi na Jehova emekpawo ya aru n’ihi iba-uba nke njehie-ya nile:

Umu-ntakiri-ya alawo dika ndi adọtara n’agha n’iru onye-nkpab͕u.

6 Ima-nma-ya nile esiwo kwa n’aru ada Zaion pua:

Ndi-isi-ya aghọwo ele nke nāchọtaghi ebe-ita-nri,

Ha we je ije nēnweghi ike n’iru onye nāchu ha.

7 Jerusalem echetawo n’ubọchi nile nke nweda-n’ala-ya na nke nwaghari-ya nile

Ihe nile ya anāchọsi ike nke diri site n’ubọchi nile nke mb͕e ochie:

Mb͕e ndi-ya dabàra n’aka onye-nkpab͕u, ma ọ dighi onye nēyere ya aka,

Ndi-nkpab͕u huru ya, ha chìri nkwusi-ya nile ọchì.

8 Jerusalem emehiewo nke-uku; n’ihi nka ka ọ ghọworo ihe ruru árú:

Ndi nile ndi nāsọpuru ya-ri elelìwo ya anya, n’ihi na ha ahuwo ọtọ-ya:

E, ya onwe-ya ezewo ume, we chigharia azu.

9 Ọrurú-ya di n’ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-ya; o chetaghi ikpe-azu-ya;

O we rida n’uzọ di ebube; ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere:

Jehova, le nweda-n’alam; n’ihi na onye-iro emewo onwe-ya ka ọ di uku.

10 Onye-nkpab͕u ab͕asawo aka-ya n’elu ihe-utọ nile nke Jerusalem:

N’ihi na ọ huwo na mba di iche iche abatawo n’ebe nsọ ya,

Bú ndi I nyere iwu bayere ha na ha agaghi-abà nime nkpọkọta I nwere.

11 Ndi-ya nile nēze ume, ha nāchọ nri;

Ha enyewo ihe nile ha anāchọsi ike n’ọnọdu ihe-oriri iweghachi nkpuru-obi:

Le, Jehova, legide anya; n’ihi na aghọwom ihe jọb͕uru onwe-ya.

12 Ọ̀ bughi unu ihe, unu nile ndi nāgabiga n’uzọ?

Legidenu, hu ma ọ di ihe-nb͕u dika ihe-nb͕um di, bú nke anēme mu,

Onye Jehova mekpaworo aru n’ubọchi iwe-Ya di ọku.

13 N’elu ka O siri zite ọku n’ọkpukpum nile, o we nwe ike n’aru ha:

Ọ b͕asaworo ukwum abua ub͕u, O mewo ka m’laghachi azu;

O mewom ka m’ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu na onye aru nādighi ike ogologo ubọchi nile.

14 Aka-Ya ekewo yoke nke njehiem nile;

Akpakọwo ha n’otù, ha arigotawo n’olum; O mewo ka ikem su ngọngọ:

Onye-nwe-ayi enyewom n’aka-ha, bú ndi m’nāpughi iguzosi ike megide.

15 Onye-nwe-ayi eledawo ndim nile di ebube anya n’etitim:

Ọ kpọsawo mb͕e akara àkà imegidem itipia umu-okorọbiam:

Ebe-nzọcha-nkpuru-vine ka Onye-nwe-ayi zọchaworo nye ada Juda nāmaghi nwoke.

16 N’ihi ihe ndia ka mu onwem nākwa ákwá; anyam, anyam nērùda miri;

N’ihi na onye-nkasi-obi nke nēweghachi nkpuru-obim di anya n’ebe m’nọ;

Umum tọb͕ọrọ n’efu, n’ihi na onye-iro di ike.

17 Zaion ab͕asawo aka-ya abua; ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere;

Jehova enyewo iwu bayere Jekob, na ndi nọ ya buruburu gābu ndi nākpab͕u ya:

Jerusalem aghọwo ihe-isọ-nsọ n’etiti ha.

18 Onye ezi omume ka Jehova bu; n’ihi na okwu-ọnu-Ya ka m’nupuworo isi megide:

Biko, nurunu, unu ndi nile di iche iche, le-kwa-nu ihe-nb͕um:

Umu-ab͕ọghọm nāmaghi nwoke na umu-okorọbiam alawo n’etiti ndi adọtara n’agha.

19 Akpọkurum ndi nāhum n’anya, ma ha onwe-ha ghọb͕urum:

Ndi-nchu-àjàm na ndi-okenyem kubìri ume n’obodom,

Mb͕e ha nāchọrọ onwe-ha ihe-oriri ka ha we weghachi nkpuru-obi-ha.

20 Le, Jehova; n’ihi na ahuhu dirim; ngiri-afọm nānum ọku;

Obim nātughari nimem; n’ihi na enupuwom isi nke-uku:

N’èzí mma-agha ab͕abawom aka nwa, n’ulo ihe dika ọnwu di.

21 Ha anuwo na onye nēze ume ka m’bu; ọ dighi onye-nkasi-obi m’nwere;

Ndi-irom nile anuwo ihe ọjọm; obi atọwo ha utọ na Gi onwe-gi emewo ya:

I gēme ka ọ bia, bú ubọchi I kpọsaworo, ha ewe di ka mu onwem.

22 Ka ihe ọjọ nile ha bia n’iru Gi;

Gi me kwa ha, dika I meworom n’ihi njehiem nile:

N’ihi na ize-umem di ọtutu, aru adighi kwa obim ike.

Categories
ABÙ-ÁKWÁ

ABÙ-ÁKWÁ 2

1 Le, ka Onye-nwe-ayi si were igwe-oji kpuchie ada Zaion n’iwe-Ya!

O siwo n’elu-igwe tuda ima-nma nke Israel n’ala,

Ọ chetaghi kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya n’ubọchi iwe-Ya.

2 Onye-nwe-ayi elowo ebe-obibi nile nke Jekob, ghara inwe ọmiko n’aru ha;

Ọ kwadawo ebe nile ewusiri ike nke ada Juda nime nrubiga-ókè nke iwe-Ya:

O tidaruwo ha ala:

O mewo ala-eze na ndi-isi-ya ka ha ghara idi nsọ.

3 O bipuwo mpi nile ọ bula nke Israel n’iwe di ọku;

O seghachiwo aka-nri-Ya azu site n’iru onye-iro:

O rechapuwo kwa Jekob dika ọku nēnwu enwu, nke nēripia buruburu.

4 Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya dika onye-iro, O werewo aka-iri-Ya guzo Onwe-ya dika onye-nkpab͕u,

We b͕ue ndi nile anya nāchosi ike:

N’ulo-ikwū nke ada Zaion ka Ọ wusiworo ọnuma-Ya dika ọku.

5 Onye-nwe-ayi adiwo ka onye-iro, Ọ lodawo Israel;

O lodawo ulo-elu-ya nile, O bibiwo ebe-Ya nile ewusiri ike:

O me ka ize-ume na isu-ude ba uba n’ada Juda.

6 Ọ napuwo kwa ulo-ntu-Ya n’ike, dika agāsi na ọ bu nke ubi ab͕ara ogige;

O bibiwo mb͕e-Ya akara àkà:

Jehova emewo ka echezọ mb͕e akara àkà na ubọchi-izu-ike nime Zaion,

O we ju eze na onye-nchu-àjà n’ọmuma nke iwe-Ya.

7 Onye-nwe-ayi ajusiwo ebe-ichu-àjà-Ya, Ọ sọwo ebe nsọ Ya oyi,

O mechibidowo mb͕idi nile nke ulo-elu-ya nile nye n’aka onye-iro:

Ha emewo ka olu-ha da udà n’ulo Jehova, dika n’ubọchi nke mb͕e akara àkà.

8 Jehova echèwo ibibi mb͕idi ada Zaion;

O setiwo eriri, O sepughi aka-Ya n’olulo:

O we me ka ékpè na mb͕idi rue újú; n’otù ka ha talatakọworo.

9 Ọnu-uzọ-ama-ya nile emikpuwo n’ala; O mewo ka ihe-ntuchi-ya nile la n’iyì, Ọ b͕ajiwo kwa ha:

Eze-ya na ndi-isi-ya nọ n’etiti mba nile ebe iwu nādighi;

Ọzọ, ndi-amuma-ya achọtaghi ọhù nke sitere na Jehova.

10 Ndi-okenye nke ada Zaion nānọdu ala, dere du;

Ha ekpokwasiwo ájá n’isi-ha; ha ekewo ákwà-nkpe n’úkwù-ha:

Umu-ab͕oghọ Jerusalem ndi nāmaghi nwoke erulatawo isi-ha n’ala.

11 Anyam abua adalawo n’isi site n’anya-miri, ngiri-afọm anuwom ọku,

Awusiwo umejum n’ala dika miri, n’ihi ntipia nke ada ndim;

N’ihi na umu-ntakiri na umu nke nāṅu ara nāda #mbà n’amá nile nke obodo.

12 Ha nāsi nne-ha, Òle ebe ọka na manya-vine di?

Mb͕e ha nāda #mbà dika onye emeruru aru n’amá nile nke obodo,

Mb͕e nkpuru-obi-ha nāwusi onwe-ya dika miri n’obi ndi bu nne-ha.

13 Gini, bu àmà M’gāb͕ara gi? gini ka M’gēji tuyere gi, gi ada Jerusalem?

Gini ka M’gēme ka gi na ya rata, ka M’we kasie gi obi, gi ada Zaion nāmaghi nwoke?

N’ihi na ihe di uku dika oké osimiri ka nb͕awa-gi bu: ònye gāgwọta gi?

14 Ndi-amuma-gi ahutaworo gi ọhù ihe-efu na ihe-nzuzu;

Ma ha ekpugheghi ajọ omume-gi, ime ka ndi-gi adọtara n’agha lata:

Kama ha ahutaworo gi ibu di iche iche nke ihe-efu na ihe-nchupu di iche iche.

15 Ndi nile ndi nāgabiga n’uzọ akuwo aka megide gi;

Ha amawo ọsọ̀ fufere ada Jerusalem isi, si:

Ọ̀ bu nka bu obodo ahu nke anākpọ Ebe mazuru nma, Ihe-obi-utọ nke uwa nile?

16 Ndi-iro-gi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide gi;

Ha amawo ọsọ̀, ta ikekere-ezé; ha asiwo, Ayi elodawo ya;

N’ezie nka bu ubọchi ahu nke ayi lere anya ya; ayi achọtawo, ayi ahuwo.

17 Jehova emewo ihe nke O zubere;

O mezuwo okwu-ọnu-Ya nke O nyere n’iwu site n’ubọchi nile nke mb͕e ochie;

Ọ kwadawo, ghara inwe ọmiko:

O we me ka onye-iro ṅuria ọṅu n’aru gi,

O mewo ka mpi nke ndi nākpab͕u gi di elu.

18 Obi-ha tikuru Onye-nwe-ayi nkpu:

Gi mb͕idi ada Zaion, me ka anya-miri rùda dika osimiri ehihie na abali;

Enyela onwe-gi izu-ike; ka nwa-anya-gi ghara ikwusi akwusi.

19 Bilie, tie nkpu n’abali, na nmalite nche di iche iche;

Wusi obi-gi dika miri na ncherita-iru Onye-nwe-ayi:

Chilie aka-gi n’ebe Ọ nọ n’ihi ndu umu-ntakiri-gi,

Ndi nāda #mbà n’agu n’isi èsí nile.

20 Le, Jehova, legide onye I meworo otú a anya!

Ndinyom, hà gēri nkpuru-ha, bú umu-ntakiri anātughari n’aka?

Àgēb͕u onye-nchu-àjà na onye-amuma n’ebe nsọ nke Onye-nwe-ayi?

21 Nwa-okoro na agadi-nwoke edinawo ala n’èzí nile;

Umu-ab͕ọghọm nāmaghi nwoke na umu-okorọbiam adawo site na mma-agha:

I b͕uwo ha n’ubọchi iwe-Gi; I b͕usiwo, I nweghi ọmiko.

22 I nākpọ, dika n’ubọchi nke mb͕e akara àkà, ujọm nile di buruburu,

Ọ dighi kwa onye b͕apuru ab͕apu ma-ọbu onye fọduru afọdu n’ubọchi nke iwe Jehova:

Umum ndi m’tughariworo n’aka zulite, onye-irom emewo ka ha gwusia.

Categories
ABÙ-ÁKWÁ

ABÙ-ÁKWÁ 3

1 Mu onwem bu nwoke ahu nke huworo nweda-n’ala site na nkpa-n’aka nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya.

2 Mu ka O duworo me ka m’jegharia n’ọchichiri ghara inwe ìhè.

3 N’ezie, mu ka Ọ nātughari aka-Ya megide ọtutu mb͕e ogologo ubọchi nile.

4 O mewo ka anu-arum na akpukpọ-arum ka nká; Ọ b͕ajiwo ọkpukpum nile.

5 O wuwo ńsí na ike-ọgwugwu dika ulo imegidem, were ya b͕am buruburu.

6 N’ebe nile b͕ara ọchichiri ka O meworo ka m’biri, dika ndi nwuru anwu site na mb͕e ebighi-ebi.

7 Ọ b͕achiwom ogige, m’we ghara ipu apu; O mewo ka ọla eji kem ab͕u di arọ́.

8 Ọzọ, mb͕e m tikuru Chineke nkpu, O mechibido ekperem uzọ.

9 O werewo nkume awara awa b͕achie uzọm nile, okporo-uzọm nile ka O meworo ka ha b͕agọ ab͕agọ.

10 Bear nke nēche anwu ka Ọ burum, ma-ọbu ọdum nke nọ n’ebe-nzuzo di iche iche.

11 Uzọm nile ka O wezugaworo, O we dọbisiem; O mewom ka m’tọb͕ọrọ n’efu.

12 Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, O guzom dika ihe edotara ib͕a àkú.

13 O mewo ka àkú nile nke àkpà-àkú-Ya ba n’akurum abua.

14 Aghọworom ndim nile ihe-ọchi, na abù ha nābù n’ikpọ ubọ-akwara ogologo ubọchi nile.

15 O mewo ka ihe nile nke nēlu ilu jum afọ, O mewo ka m’ṅujue wormwood afọ.

16 O were umu nkume kujie ezém nile, Ọ turawom na ntu.

17 I juwo nkpuru-obim ka ọ ghara inọ n’udo; echezọwom ọdi-nma.

18 M’we si, Ikem alawo n’iyì, ya na ncherem nke sitere na Jehova.

19 Cheta nweda-n’alam na nwagharim, na wormwood na ńsí.

20 Nkpuru-obim nēcheta ha nke-ọma, we ruda n’ala nimem.

21 Nka ka m’nēweghachi n’obim, n’ihi nka ka m’nēchere.

22 O sitere n’ebere nile nke Jehova na emeghi ka ayi gwusia, n’ihi na obi-ebere-Ya nile agwughi.

23 Ha di ọhu kwa-ututu; ihe riri nne ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi bu.

24 Òkèm bu Jehova, ka nkpuru-obim siri; n’ihi nka ka m’gēchere Ya.

25 Jehova di nma n’ebe ndi nēle anya Ya nọ, Ọ di nma n’ebe nkpuru-obi nke nāchọ Ya nọ.

26 Ọ di nma ka madu chere nzọputa Jehova, dere kwa du n’ichere ya.

27 Ọ diri nwoke nma ka ọ nēbu yoke na mb͕e ọ di na nwata.

28 Ya nọdu náni ya iche, debe ọnu-ya du, n’ihi na Ọ tukwasiwo ya n’olu-ya.

29 Ya tiye ọnu-ya n’ájá; ma eleghi anya ọ di olile-anya gādi.

30 Ya mere ǹtì-ya nye onye nēti ya ihe; ka ita-uta ju ya afọ.

31 N’ihi na Onye-nwe-ayi agaghi-aju rue mb͕e ebighi-ebi.

32 N’ihi na ọ buru na O mekpa aru, ma Ọ gēnwe obi-ebere dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di.

33 N’ihi na Ọ dighi-esite n’obi-Ya weda umu madu n’ala, mekpa ha aru.

34 Izọpia ndi-nkpọrọ nile nke uwa n’okpuru ukwu,

35 Iwezuga ikpé ọ bula n’iru Onye kachasi ihe nile elu,

36 Ime ka madu b͕agọ ab͕agọ n’okwu-ikpé-ya: Onye-nwe-ayi eleghi ihe ndia anya ọma.

37 Ònye bu onye ahu nke kwuworo okwu, o we rè, mgbe onyenwe-ayi enyeghi iwu?

38 Ọ̀ bughi n’ọnu Onye kachasi ihe nile ka ihe ọjọ na ezi ihe si aputa?

39 Gini mere madu nke di ndu ji atamu ntamu, onye ọ bula, bayere ahuhu nmehie-ya nile?

40 Ka ayi gwuputa ala uzọ nile ayi, nyochaputa ha, laghachikuru Jehova.

41 Ka ayi weliere Chineke Nke bi n’elu-igwe obi-ayi n’ọbu-aka-ayi abua.

42 Ayi onwe-ayi ejehiewo nupu kwa isi; Gi onwe-gi ab͕agharaghi.

43 I werewo iwe kpuchie Onwe-gi, we chua ayi; I b͕uwo, I nweghi ọmiko.

44 I werewo igwe-oji kpuchie Onwe-gi, ka ekpere-ayi we ghara igabiga.

45 Ihe azachapuru azachapu na ihe ajuru aju ka I nēme ayi n’etiti ndi nile di iche iche.

46 Ndi-iro-ayi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide ayi.

47 Oké egwu na olùlù eruwo ayi aru, itọb͕ọ-n’efu na ntipia.

48 Ọtutu iyi nke juputara na miri ka anyam nērùda, n’ihi ntipia nke ada ndim.

49 Anyam nāwusi dika miri, ọ dighi-eguzo kwa du, ghara ikwusi akwusi,

50 Rue mb͕e Jehova gēsi n’elu-igwe lepu anya, hu.

51 Anyam nēme nkpuru-obim ihe, n’ihi umu-ndinyom nile nke obodom.

52 Ndi bu ndi-irom n’efu achusiwo ntám ike dika nnunu.

53 Ha ekpochapuwo ndum n’olùlù, we tuam nkume.

54 Miri rubigaram n’isi; asirim, Ebipuwom.

55 Esirim n’olùlù dichasi ala kpọkue aha-Gi, Jehova.

56 Olum ka I nuru; ezobela nti-Gi n’iku-umem, na ntikum.

57 I biaruru nso n’ubọchi m’kpọkuru Gi: I siri, Atula egwu.

58 Onye-nwe-ayi, I kpezuwo ọnu nke nkpuru-obim; I b͕aputawo ndum.

59 Jehova, I huwo nb͕agọm; Gi kpe ikpem.

60 I huwo ibọ̀-ọ́bọ̀ nile ha na èchìchè nile ha n’arum.

61 I nuwo ita-uta-ha, Jehova, na èchìchè nile ha megidem;

62 Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi nēbili imegidem, na ntughari-obi-ha megidem ogologo ubọchi nile.

63 Legide inọdu-ala-ha, na nbili-ọtọ-ha; mu onwem bu abù ha nābù n’ikpọ ubọ-akwara.

64 I gēnyeghachi ha nmeso-ha, Jehova, dika ọlu aka-ha si di.

65 I gēnye ha ihe-nkpudo obi, bú ọb͕ub͕a-iyi I b͕ara ha.

66 I gāchu ha n’iwe, kpochapu ha n’okpuru elu-igwe nke Jehova.