Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 36

1 O rue, n’arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, na okwu a ruru Jeremaia nti site na Jehova, si,

2 Were n’onwe-gi akwukwọ-npiakọta, de nime ya okwu nile nke M’gwaworo gi imegide Israel, na imegide Juda, na imegide mba nile, site n’ubọchi M’gwara gi okwu, site n’ubọchi Josaia, we rue ta.

3 Eleghi anya ulo Juda gānu ihe ọjọ ahu nile nke Mu onwem nēchè ime ha; ka ha we lata, onye o bula o si n’uzọ ọjọ ya lata; ka M’we b͕aghara ajọ omume-ha na nmehie-ha.

4 Jeremaia we kpọ Beruk nwa Neraia; Beruk we dere n’ọnu Jeremaia okwu nile nke Jehova, nke Ọ gwara ya-ri, n’akwukwọ-npiakọta.

5 Jeremaia we nye Beruk iwu, si, Mu onwem bu onye eb͕ochibidoworo; apughm ibà n’ulo Jehova:

6 ma gi onwe-gi je, gua n’akwukwọ-npiakọta ahu, nke i deworo site n’ọnum, okwu nile nke Jehova na nti ndi Israel, n’ulo Jehova n’ubọchi obubu-ọnu: ọ bu kwa na nti Juda nile ndi si n’obodo nile ha abia ka i gāgu ha.

7 Eleghi anya aririọ-amara-ha gāda n’iru Jehova, ha ewe lata, onye ọ bula o si n’uzọ ọjọ ya lata: n’ihi na ọ di uku, bú iwe ahu na ọnuma ahu nke Jehova kwuworo megide ndi nka.

8 Beruk nwa Neraia we me dika ihe nile si di nke Jeremaia, bú onye-amuma, nyere ya n’iwu, o we gua n’akwukwọ ahu okwu nile nke Jehova n’ulo Jehova.

9 O rue, n’arọ nke-ise nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, n’ọnwa nke-iteghete, na ndi nile ndi nọ na Jerusalem, na ndi nile ndi si n’obodo nile nke Juda abata na Jerusalem, kpọsara obubu-ọnu n’iru Jehova.

10 Beruk we gua n’akwukwọ ahu okwu nile nke Jeremaia n’ulo Jehova, n’ime-ulo Gemaraia nwa Shefan, bú ode-akwukwọ, n’ogige nke di n’elu, n’oghere ọnu-uzọ-ama ọhu nke ulo Jehova, na nti ndi Israel nile.

11 Maikaia nwa Gemaraia, nwa Shefan, we nuru okwu nile nke Jehova nke sitere n’akwukwọ ahu,

12 o we rida n’ulo eze, rue ime-ulo nke ode-akwukwọ: ma, le, n’ebe ahu ka ndi-isi nile nānọdu, bú Elishama ode-akwukwọ, na Delaia nwa Shemaia, na Elnetan nwa Akboa, na Gemaraia nwa Shefan, na Zedekaia nwa Hananaia, na ndi-isi nile.

13 Maikaia we gosi ha okwu nile ọ nuru, mb͕e Beruk nāgu akwukwọ ahu na nti ndi Israel nile.

14 Ndi-isi nile we zìe Jehudi nwa Netanaia, nwa Shelemaia, nwa Kushi, jekuru Beruk, si, Akwukwọ-npiakọta ahu nke iguworo ihe nime ya na nti ndi Israel, were n’aka-gi bia. Beruk nwa Neraia we were akwukwọ-npiakọta ahu n’aka-ya, biakute ha.

15 Ha we si ya, Biko, nọdu ala, gua ya na nti-ayi. Beruk we gua ya na nti-ha.

16 O rue, mb͕e ha nusiri okwu ndia nile, na ha turu oké egwu, onye na ibe-ya, ha we si Beruk, Ayi aghaghi igosi eze okwu ndia nile.

17 Ha we jua Beruk, si, Biko, gosi ayi, Ì siri aṅa deputa okwu ndia nile n’ọnu-ya?

18 Beruk we si ha, N’ọnu-ya ka ọ nākpọrọm okwu ndia nile, ma mu onwem were ink ede ha n’akwukwọ a.

19 Ndi-isi we si Beruk, Je, zobe onwe-gi, gi onwe-gi na Jeremaia; ekwe-kwa-la onye ọ bula mara ebe unu onwe-unu nọ.

20 Ha we bakuru eze n’ogige; ma ha debereri akwukwọ-npiakọta ahu n’ime-ulo Elishama, bú ode-akwukwọ; ha we gosi okwu nile na nti abua nke eze.

21 Eze we ziga Jehudi iweta akwukwọ-npiakọta ahu: o we weputa ya n’ime-ulo Elishama, bú ode-akwukwọ. Jehudi we gua ya na nti abua nke eze, na na nti ndi-isi nile ndi nēguzo n’akuku eze.

22 Ma eze nānọdu n’ulo mb͕e oyi n’ọnwa nke-iteghete: ọku nēnwu kwa n’ite-ọku nke di n’iru ya.

23 O rue, mb͕e Jehudi gusiri ibe akwukwọ atọ ma-ọbu anọ, na o ji mma ode-akwukwọ bìkasia ya, tubà ya n’ọku nke di n’ite-ọku, rue mb͕e akwukwọ-npiakọta ahu resiri n’ọku nke di n’ite-ọku.

24 Ma ha atughi oké egwu, ha adọwaghi kwa uwe-ha, bú eze na ndi-orù-ya nile ndi nānu okwu ndia nile.

25 Ọzọ kwa, Elnetan na Delaia na Gemaraia riọrọri eze arìriọ ka ọ ghara isure akwukwọ-npiakọta ahu: ma o geghi ha nti.

26 Eze we nye Jeramil nwa eze na Seraia nwa Azriel na Shelemaia nwa Abdeel iwu iwere Beruk, bú ode-akwukwọ, Jeremaia, bú onye-amuma: ma Jehova zobere ha.

27 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, mb͕e eze suresiri akwukwọ-npiakọta ahu, na okwu nile nke Beruk deputara n’ọnu Jeremaia, si,

28 Were kwa n’onwe-gi akwukwọ-npiakọta ọzọ, dekwasi na ya okwu mbu nile nke di n’elu akwukwọ-npiakọta mbu, nke Jehoiakim, bú eze Juda, sureworo ọku.

29 Ma i gēkwu okwu bayere Jehoiakim, bú eze Juda, si, Otú a ka Jehova siri: Gi onwe-gi esurewo akwukwọ-npiakọta nka ọku, si, Gini mere i ji dekwasi n’akwukwọ a, si, Eze Babilon aghaghi ibia bibie ala nka, me ka madu na anumanu kwusi nime ya?

30 N’ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere Jehoiakim, bú eze Juda, si: Ọ gaghi-enwe onye ganānọkwasi n’oche-eze Devid: ọzọ, ozu-ya gābu ihe etufuworo nye ọkpukpọ-nku n’ehihie, nye kwa ọtutu-oyi n’abali.

31 M’gēji kwa ajọ omume-ha leta ya, leta kwa nkpuru-ya, leta kwa ndi-orù-ya; M’gēme kwa ka ihe ọjọ ahu nile nke M’gwara ha, ma ha anughi, biakwasi ha, biakwasi kwa ndi bi na Jerusalem, biakwasi kwa ndi Juda.

32 Ma Jeremaia were akwukwọ-npiakọta ọzọ nye Beruk nwa Neraia, bú ode-akwukwọ; o we dere n’ọnu Jeremaia n’elu ya okwu nile nke akwukwọ ahu nke Jehoiakim, bú eze Juda, surereri n’ọku; ọzọ kwa, atukwasiri n’elu ha ọtutu okwu dika ha.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 37

1 Zedekaia nwa Josaia we ghọ eze n’ọnọdu Konaia nwa Jehoiakim, onye Nebukadreza, bú eze Babilon, mere ka ọ buru eze n’ala Juda.

2 Ma ọ geghi nti, ya onwe-ya, ma ndi-orù-ya, ma ndi ala ahu, n’okwu nile nke Jehova, nke O kwuru site n’aka Jeremaia, bú onye-amuma.

3 Zedekaia, bú eze, we zìe Jehukal nwa Shelemaia, na Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, jekuru Jereamia, bú onye-amuma, si, Biko, kpere ayi Jehova, bú Chineke-ayi, ekpere.

4 Ma Jeremaia nābata nāpu kwa n’etiti ndi Israel: n’ihi na ha etiyeghi ya n’ulo-nkpọrọ.

5 Ọzọ, usu-ndi-agha Fero esiwo n’Ijipt puta: ndi Kaldea ndi nānọchigide Jerusalem n’agha we nuru akukọ-ha, ha we si n’imegide Jerusalem rigo.

6 Okwu Jehova we rue Jeremaia, bú onye-amuma, nti, si,

7 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri: Otú a ka unu gāsi eze Juda, onye zìworo unu biakutem ijum ase; Le, usu-ndi-agha Fero, nke putaworo iyere unu aka, gālaghachi n’ala-ya, bú Ijipt.

8 Ndi Kaldea gābiaghachi kwa, buso obodo a agha; ha gēwere kwa ya, sure ya n’ọku.

9 Otú a ka Jehova siri: Unu arafula nkpuru-obi-unu, si, Ndi Kaldea aghaghi isi n’imegide ayi la: n’ihi na ha agaghi-ala.

10 N’ihi na ọ buru na unu etib͕usia usu-ndi-agha nile nke ndi Kaldea ndi nēbuso unu agha, nání ndi adupúru adupú ewe fọdu n’etiti ha, ma ha gēbili, onye ọ bula n’ulo-ikwū-ya, we sure obodo a n’ọku.

11 O rue, mb͕e usu-ndi-agha nke ndi Kaldea siri n’imegide Jerusalem rigo n’ihi usu-ndi-agha Fero,

12 na Jeremaia siri na Jerusalem pua ije ala Benjamin, iketa òkè-ya n’ebe ahu, n’etiti ndi Israel.

13 O rue, mb͕e ọ nọ n’ọnu-uzọ-ama Benjamin, na otù onye-nwe nlekọta nọ n’ebe ahu, onye aha-ya bu Iraija nwa Shelemaia, nwa Hananaia; o we jide Jeremaia, bú onye-amuma, si, Ndi Kaldea ka gi onwe-gi nādakuru.

14 Jeremaia we si, Ọ bu okwu-ugha; adighm-adakuru ndi Kaldea; ma o geghi ya nti: Iraija we jide Jeremaia, me ka ọ biakute ndi-isi.

15 Ndi-isi we wesa Jeremaia iwe, tie ya ihe, tiye ya n’ulo-nkpọrọ, bú ulo Jonatan ode-akwukwọ; n’ihi na ulo ahu ka ha mereri ulo-nkpọrọ.

16 Mb͕e Jeremaia batara n’ulo olùlù, na n’ime-ulo ntà ya, Jeremaia we nọdu n’ebe ahu ọtutu ubọchi;

17 eze, bú Zedekaia, we ziga, kuta ya: eze we jua ya n’ulo-ya na nzuzo, si, Ọ̀ di okwu ọ bula sitere na Jehova? Jeremaia we si, Okwu di. O we si, N’aka eze Babilon ka agēnye gi.

18 Jeremaia we si eze, bú Zedekaia, Gini ka m’mehieworo megide gi, ma-ọbu megide ndi-orù-gi, ma-ọbu megide ndi nka, na unu tiyeworo mu onwem n’ulo-nkpọrọ?

19 Òle ebe kwa ka ndi-amuma-unu nọ, bú ndi buru unu amuma, si, Eze Babilon agaghi-abia imegide unu, ma-ọbu imegide ala nka?

20 Ma ub͕u a, biko, nuru, onye-nwem, eze: biko, ka aririọ-amaram da n’iru gi; eme-kwa-la ka m’laghachi n’ulo Jonatan, bú ode-akwukwọ, ka m’we ghara inwu n’ebe ahu.

21 Eze, bú Zedekaia, we nye iwu, ha we tiye Jeremaia n’ogige ulo-nche, nēnye ya otù ob͕e achicha kwa-ubọchi site n’èzí ndi-osi-ite, rue mb͕e achicha nile nke di n’obodo gwusiri. Jeremaia we nọgide n’ulo-nche.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 38

1 Shefataia nwa Matan, na Gedalaia nwa Pashua, na Jukal nwa Shelemaia, na Pashua nwa Malkija, we nuru okwu nile nke Jeremaia nāgwa ndi Israel nile, si,

2 Otú a ka Jehova siri, Onye nānọgide n’obodo a gānwu site na mma-agha, na site n’oké unwu, na site n’ajọ ọria nēfe efe: ma onye nāpukuru ndi Kaldea gādi ndu, ndu-ya ewe ghọrọ ya ihe-nkwata, o we di ndu.

3 Otú a ka Jehova siri, Aghaghi inye obodo a n’aka usu-ndi-agha nke eze Babilon, ọ gēwere kwa ya.

4 Ndi-isi we si eze, Biko, ka eme ka nwoke a nwua; n’ihi na ya onwe-ya nēme ka aka ndi-agha kuda, bú ndi fọduru n’obodo a, na aka ndi Israel nile, n’igwa ha okwu dika okwu ndia: n’ihi na nwoke a adighi-achọrọ ndi nka udo, kama ọ bu ihe ọjọ.

5 Eze, bú Zedekaia, we si, Le, onye ahu di n’aka-unu: n’ihi na eze abughi onye puru ime ihe ọ bula megide unu.

6 Ha we were Jeremaia, tubà ya n’olùlù Malkija nwa eze, nke di n’ogige ulo-nche: ha we chiri udọ̀ rada Jeremaia. Ma miri adighi n’olùlù ahu, ọ bu nání apiti: Jeremaia we mibe n’apiti ahu.

7 Ebed-melek, bú onye Etiopia, onye bu onozi, nke nọ n’ulo eze, we nuru na ha tiyereri Jeremaia n’olùlù; ma eze nānọdu n’ọnu-uzọ-ama Benjamin;

8 Ebed-melek we si n’ulo eze puta, gwa eze okwu, si,

9 Onye-nwem eze, ndikom ndia emewo ihe ọjọ n’ihe nile nke ha meworo Jeremaia, bú onye-amuma, onye ha tubàworo n’olùlù ahu; o we nọ n’ọnwu n’ọnọdu-ya n’ihi oké unwu: n’ihi na nri adighi kwa ọzọ n’obodo a.

10 Eze we nye Ebed-melek, bú onye Etiopia, iwu, si, Si n’ebe a chiri orú ndikom na iri n’aka-gi, me ka Jeremaia, bú onye-amuma, si n’olùlù ahu rigoputa, tutu ọ nwua.

11 Ebed-melek we chiri ndikom ahu n’aka-ya, ba n’ulo eze n’okpuru ulo-àkù, chiputa n’ebe ahu nkirika ákwà nke dọkara adọka na nkirika ákwà nke kara nká, o we chiri udọ̀ radara ha Jeremaia n’olùlù ahu.

12 Ebed-melek, bú onye Etiopia, we si Jeremaia, Biko, tiye nkirika ákwà ndia nke dọkara adọka na nke kara nká n’okpuru nkpa-abu-gi abua n’okpuru udọ̀. Jeremaia we me otú a.

13 Ha we chiri udọ̀ ahu dọgota Jeremaia, we me ka o si n’olùlù ahu rigoputa: Jeremaia we nọgide n’ogige ulo-nche ahu.

14 Eze, bú Zedekaia, we ziga, kutara onwe-ya Jeremaia, bú onye-amuma, rue nbata nke-atọ nke di n’ulo Jehova: eze we si Jeremaia, Mu onwem gaje iju gi otù ihe; ezonarilam ihe ọ bula.

15 Jeremaia we si Zedekaia, Mb͕e m’gēgosi gi, ì gaghi-eme ka m’nwua n’ezie? ọzọ, mb͕e m’gādu gi ọdu, i gaghi-egem nti.

16 Eze, bú Zedekaia, we ṅuara Jeremaia iyi na nzuzo, si, Jehova nādi ndu, bú Onye ahu nke nyere ayi ndu a, m’gaghi-eme ka i nwua ma-ọli, m’gaghi-enye kwa gi ma-ọli n’aka ndikom ndia ndi nāchọ ndu-gi.

17 Jeremaia we si Zedekaia, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, siri: Ọ buru na i gāpukuru ndi-isi eze Babilon n’ezie, nkpuru-obi-gi gādi kwa ndu, agaghi-esure kwa obodo a n’ọku; i gādi kwa ndu, gi onwe-gi na ulo-gi:

18 ma ọ buru na i pukughi ndi-isi eze Babilon, agēnye kwa obodo a n’aka ndi Kaldea, ha gēsure kwa ya n’ọku, gi onwe-gi agaghi-ewepuga onwe-gi n’aka-ha.

19 Eze, bú Zedekaia, we si Jeremaia, Mu onwem nātu egwu ndi-Ju ndi dakuruworo ndi Kaldea, na ha gēnyem n’aka-ha, ha ewe kwam emò.

20 Jeremaia we si, Ha agaghi-enye gi n’aka-ha. Biko, ge nti olu Jehova, n’ihe nke mu onwem nāgwa gi: o we diri gi nma, nkpuru-obi-gi gādi kwa ndu.

21 Ma ọ buru na gi onwe-gi aju na i gaghi-apu, nka bu okwu nke Jehova meworo ka m’hu:

22 Le, ndinyom ahu nile ndi fọduru n’ulo eze Juda gābu ndi emeworo ka ha pukuru ndi-isi eze Babilon, ndinyom ahu ganāsi kwa, Ndi gi na ha di n’udo akpaliwo gi, we nwe ike n’aru gi: ukwu-gi abua emiwo n’apiti, ha we laghachi azu.

23 Ọ bu kwa ndinyom-i nile na umu-gi ka ha ganēme ka ha pukuru ndi Kaldea: gi onwe-gi agaghi-ewepuga onwe-gi n’aka-ha, kama aka eze Babilon gējide gi: ọ bu kwa obodo a ka i gēsure n’ọku.

24 Zedekaia we si Jeremaia, Ekwela ka onye ọ bula mara okwu ndia, i gaghi-anwu kwa.

25 Ma mb͕e ndi-isi gānu na mu na gi ekwuwo okwu, ha we biakute gi, si gi, Biko, gosi ayi ihe i gwaworo eze; ezonarila ayi ya, ayi agaghi-eme kwa ka i nwua: gosi kwa ayi ihe eze gwara gi:

26 i gāsi kwa ha, Mu onwem nēme ka aririọ-amaram da n’iru eze, ka ọ ghara ime ka m’laghachi n’ulo Jonatan, inwu n’ebe ahu.

27 Ndi-isi nile we biakute Jeremaia, jua ya: o we gosi ha dika okwu ndia nile si di nke eze nyere ya n’iwu. Ha we debe ọnu-ha du, rapu ya; n’ihi na anughi okwu ahu.

28 Jeremaia we nọgide n’ogige ulo-nche rue ubọchi ewere Jerusalem. O rue, mb͕e ewere Jerusalem,

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 39

1 (n’arọ nke-iteghete nke Zedekaia, bú eze Juda, n’ọnwa nke-iri, ka Nebukadreza, bú eze Babilon, na usu-ndi-agha-ya nile, biaruru Jerusalem, we nọchigide ya n’agha;

2 n’arọ nke-iri-na-otù nke Zedekaia, n’ọnwa nke-anọ, n’ubọchi nke-iteghete nke ọnwa ahu, ka awapuru n’obodo ahu:)

3 na ndi-isi nile nke eze Babilon batara, we nọdu n’ọnu-uzọ-ama nke etiti, bú Neagal-shareza, na Samga-nebo, na Sasekim, bú Rab-saris, na Neagal-shareza, bú Rab-mag, na ndi-isi nile nke eze Babilon fọduru.

4 O rue, mb͕e Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-agha nile huru ha, na ha b͕alagara, were abali si n’obodo ahu pua, n’uzọ ubi eze ab͕ara ogige, n’ọnu-uzọ-ama nke di n’etiti mb͕idi abua: o we pua ga n’uzọ Araba.

5 Usu-ndi-agha nke ndi Kaldea we chua ha n’azu; rue Zedekaia aru n’ala ihe nādighi nke Jeriko: ha we jide ya, me ka ọ rigokuru Nebukadreza, bú eze Babilon, rue Ribla n’ala Hemat, o we kwue okwu ikpé n’ebe ọ nọ.

6 Eze Babilon we b͕ue umu-ndikom Zedekaia nime Ribla n’anya-ya: ọ bu kwa ndi nile nke Juda amara aha-ha ka eze Babilon b͕uru.

7 O me-kwa-ra ka Zedekaia kpue ìsì n’anya-ya abua, o were kwa ihe-ọla eji ke ukwu ke ya ab͕u, ime ka ọ ba Babilon.

8 Ọ bu kwa ulo eze na ulo nile nke ndi Israel ka ndi Kaldea surere n’ọku, ha kwatu-kwa-ra mb͕idi nile nke Jerusalem.

9 Ma ndi Israel nke fọduru, bú ndi fọduru n’obodo ahu, na ndi dapuru adapu, bú ndi dapuru jekuru ya, na ndi Israel fọduru, bú ndi fọduru n’ebe ahu, ndia ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha je biri na Babilon.

10 Ma Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ufọdu nime ndi Israel ndi nēnweghi ike, bú ndi nēnweghi ihe ọ bula, fọdu n’ala Juda, o we nye ha ubi-vine na ubi n’ubọchi ahu.

11 Nebukadreza, bú eze Babilon, we nye Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, iwu bayere Jeremaia, si,

12 Were ya, ka anya-gi abua di n’aru ya, eme-kwa-la ya ihe ọjọ ọ bula; kama dika ọ gēsi gwa gi, me ya otú a.

13 Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, we ziga, ya na Nebushazban, bú Rab-saris, na Neagal-shareza, bú Rab-mag, na ndi-isi nile nke eze Babilon;

14 ha we ziga, weputa Jeremaia n’ogige ulo-nche, nye ya n’aka Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, ka o we me ka ọ pua la: o we biri n’etiti ndi Israel.

15 Ọ bu kwa Jeremaia ka okwu Jehova ruru nti, mb͕e ọ nọ ka onye eb͕ochibidoworo n’ogige ulo-nche, si,

16 Je, gwa Ebed-melek, bú onye Etiopia, okwu, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M’gaje ime ka okwum nile biarue obodo a ime ya ihe ọjọ, ọ bughi ime ya ezi ihe; ha gādi kwa n’iru gi n’ubọchi ahu.

17 Ma M’gānaputa gi ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): agaghi-enye kwa gi n’aka ndi ahu gi onwe-gi nātu egwu ha.

18 N’ihi na aghaghm ime ka i wepuga onwe-gi, ọ bughi kwa na mma-agha ka i gāda, kama ndu-gi gāghọrọ gi ihe-nkwata: n’ihi na i b͕abàwo nimem: ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 40

1 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, zilagasiri ya site na Rema, ka o weresiri ya mb͕e ọ bu onye ejiri nkpọrọ ke ab͕u n’etiti ndi Jerusalem na Juda nile ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, bú ndi emere ka ha je biri na Babilon.

2 Onye-isi ndi-ob͕ū we were Jeremaia, si ya, Jehova, bú Chineke-gi, kwuru ihe ọjọ a megide ebe a:

3 Jehova we me ka ọ bia, O we me dika O kwuru; n’ihi na unu emehiewo megide Jehova, ma unu egeghi nti olu-Ya, n’ihi nka ka ihe a ruworo unu aru.

4 Ma ub͕u a, le, atọpuwom i ta na nkpọrọ nke di n’aka-gi. Ọ buru na ọ di nma a’anya-gi isorom bia na Babilon, bia, anyam gādi kwa a’aru gi; ma ọ buru na ọ jọrọ njọ n’anya-gi isorom bia na Babilon, ghara: le, ala nka nile di n’iru gi; n’ebe di nma na n’ebe ziri ezi n’anya-gi ije, je n’ebe ahu.

5 Ma mb͕e ọ kālaghachighi, ọ si ya, Ma-ọbu laghachikuru Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, onye eze Babilon meworo onye-nlekọta obodo nile nke Juda, gi na ya biri n’etiti ndi-gi: ma-ọbu je ebe ọ bula ziri ezi n’anya-gi ije. Onye-isi ndi-ob͕ū we nye ya òkè ihe-oriri na onyinye, zilaga ya.

6 Jeremaia we biakute Gedalaia nwa Ahaikam rue Mizpa, ya na ya we biri n’etiti ndi Israel ndi fọduru n’ala-ha.

7 Ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha ndi nọ n’ọhia, ha onwe-ha na ndikom-ha, we nu na eze Babilon mere Gedalaia nwa Ahaikam onye-nlekọta n’ala-ha, na o me-kwa-ra ya onye-nlekọta nke ndikom na ndinyom na umu-ntakiri, bú ufọdu nime ndi nēnweghi ike n’ala, nime ndi anēmeghi ka ha je biri na Babilon;

8 ha we biakute Gedalaia rue Mizpa, bú Ishmael nwa Netanaia, na Johanan na Jonatan, bú umu Karea, na Seraia nwa Tanhumet, na umu Efai, bú onye Netofa, Jezanaia nwa onye Meaka, ha onwe-ha na ndikom-ha.

9 Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, we ṅuara ha iyi, ṅu-kwa-ra ndikom-ha, si, Unu atula egwu ifè ndi Kaldea: birinu n’ala, fè kwa eze Babilon, ọ gādi-kwa-ra unu nma.

10 Ma mu onwem, le, m’ganēbi na Mizpa, iguzo n’iru ndi Kaldea, ndi gābiakute ayi: ma unu onwe-unu, chikọtanu manya-vine na nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru na manu, tiye ha n’ihe-unu, biri-kwa-nu n’obodo nile unu nke unu wereworo.

11 Ọzọ kwa, ndi-Ju nile ndi nọ na Moab, na n’etiti umu Amon, na n’Edom, na ndi nọ n’ala nile, nuru na eze Babilon enyewo Juda ndi fọduru, na o mewo kwa Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, onye-nlekọta-ha;

12 ndi-Ju nile we si n’ebe nile achugara ha-ri lata, we bata n’ala Juda, biakute Gedalaia, rue Mizpa, we chikọta manya-vine na nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru nke-uku.

13 Ọzọ, Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha ndi nọ n’ọhia, biakutere Gedalaia rue Mizpa,

14 si ya, Ì mara n’ezie na Bealis, bú eze umu Amon, ezitewo Ishmael nwa Netanaia itib͕u gi onwe-gi? Ma Gedalaia nwa Ahaikam ekweghi ihe ha kwuru.

15 Johanan nwa Karea we gwa Gedalaia okwu na nzuzo nime Mizpa, si, Biko, ka m’je, m’gētib͕u kwa Ishmael nwa Netanaia, ma ọ dighi onye ọ bula gāma: n’ihi gini ka o gētib͕u gi onwe-gi, Juda nile ewe b͕asa, bú ndi achikọtaworo n’ebe i nọ, ndi Juda fọduru ewe la n’iyì?

16 Gedalaia nwa Ahaikam we si Johanan nwa Karea, Emela ihe a: n’ihi na okwu-ugha ka gi onwe-gi nēkwu bayere Ishmael.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 41

1 O rue, n’ọnwa nke-asa, na Ishmael nwa Netanaia, nwa Elishama, onye sitere na nkpuru ndi nwe ala-eze, onye bu kwa otù nime ndi-isi nke eze, ya na-ndikom iri, biakutere Gedalaia nwa Ahaikam rue Mizpa; ha we rikọ nri n’ebe ahu na Mizpa.

2 Ishmael nwa Netanaia we bilie, ya na ndikom iri ahu ndi ya na ha yikọrọ bia, ha we were mma-agha tib͕ue Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, we me ka ọ nwua, bú onye eze Babilon mere onye-nlekọta ala ahu.

3 Ọ bu kwa ndi-Ju nile ndi ha na ya, bú Gedalaia, nọ, nime Mizpa, na ndi Kaldea ndi ahuru n’ebe ahu, bú ndi-agha, ka Ishmael tib͕uru.

4 O rue, n’ubọchi nke-abua mb͕e emesiri ka Gedalaia nwua, ma ọ dighi onye ọ bula mara ya,

5 na madu ufọdu siri na Shekem, si kwa na Shailo, si kwa na Sameria, bia, bú ọgu ndikom anọ, ndi akọpusiri afu-ọnu-ha, ndi uwe nile ha dọwara adọwa, ndi nēbì kwa onwe-ha mma, jide onyinye-inata-iru-ọma na frankincense n’aka-ha, iwebata ya n’ulo Jehova.

6 Ishmael nwa Netanaia we si na Mizpa pua izute ha, nēje ije nākwa ákwá: o rue, mb͕e o zutere ha, na ọ siri ha Biakutenu Gedalaia nwa Ahaikam.

7 O rue, mb͕e ha batara n’etiti obodo, na Ishmael nwa Netanaia b͕uru ha, tubà ha n’etiti olùlù, ya onwe-ya na ndikom ndi ya na ha nọ.

8 Ma achọtara ndikom iri n’etiti ha ndi siri Ishmael, Emela ka ayi nwua: n’ihi na ayi nwere àkù zoro ezo n’ọhia, bú ọka wheat, na ọka barley, na manu, na manu-aṅu. O we rapu, ghara ime ka ha nwua n’etiti umu-nne-ha.

9 Ma olùlù ahu ebe Ishmael tubàra ozu nile nke ndikom ahu ndi o tib͕uru, n’akuku Gedalaia, (olùlù ahu bú nke Esa, bú eze, mereri n’ihi Beasha, bu eze Israel,) olùlù ahu ka Ishmael nwa Netanaia were ndi eb͕uru eb͕u tujue.

10 Ishmael we dọta ndi Israel nile fọduru ndi nọ na Mizpa n’agha, bú umu-ndinyom eze, na ndi Israel nile fọduru na Mizpa, ndi Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere Gedalaia nwa Ahaikam onye-nlekọta-ha: Ishmael nwa Netanaia we dọta ha n’agha, je igabigakuru umu Amon.

11 Johanan nwa Karea na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha so ya we nu ihe ọjọ ahu nile nke Ishmael nwa Netanaia mere,

12 ha we chiri ndikom-ha nile, je ibuso Ishmael nwa Netanaia agha, ha we chọta ya n’akuku miri bara uba nke di na Gibeon.

13 O rue, mb͕e ndi Israel nile ndi ha na Ishmael nọ huru Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha ndi ya na ha nọ, ha we ṅuria ọṅu.

14 Ndi Israel nile ndi Ishmael siri na Mizpa dọta n’agha we chigharia, lata, jekuru Johanan nwa Karea.

15 Ma Ishmael nwa Netanaia chiri ndikom asatọ wepuga onwe-ya n’aka Johanan, jekuru umu Amon.

16 Johanan nwa Karea na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha so ya we chiri ndi Israel nile fọduru, bú ndi o mere ka ha si n’aka Ishmael nwa Netanaia lata, site na Mizpa, mb͕e o tib͕usiri Gedalaia nwa Ahaikam, bú ndikom, ndi bu ndi-agha, na ndinyom, na umu-ntakiri, na ndi-onozi, ndi o mere ka ha si na Gibeon lata:

17 ha we je, nọdu na Gerut Kimham, nke di n’akuku Bet-lehem, ije ba n’Ijipt,

18 n’ihi ndi Kaldea: n’ihi na ha turu egwu ha, n’ihi na Ishmael nwa Netanaia etib͕uwo Gedalaia nwa Ahaikam, onye eze Babilon mere onye-nlekọta ala-ha.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 42

1 Ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha, na Johanan nwa Karea, na Jezanaia nwa Hoshaia, na ndi Israel nile site n’onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku, we biarue nso,

2 si Jeremaia, bú onye-amuma, Biko, ka aririọ-amara-ayi da n’iru gi, gi kpere ayi Jehova, bú Chineke-gi, ekpere, kpe ekpere bayere ndia nile fọduru; n’ihi na ayi fọduru nànì madu ole-na-ole si n’ọtutu madu puta, dika anya-gi abua si ahu ayi:

3 ka Jehova, bú Chineke-gi, we gosi ayi uzọ ahu nke ayi gēje ije nime ya, na ihe ayi gēme.

4 Jeremaia, bú onye-amuma, we si ha, Anuwom; le, m’gaje ikpere Jehova, bú Chineke-unu, ekpere, dika okwu nile nke unu si di; ọ gēru kwa na ihe ọ bula nke Jehova gāza unu, m’gēgosi unu ya; m’gaghi-eb͕ochinari unu ihe ọ bula.

5 Ndi ahu we si Jeremaia, Ka Jehova buru onye-àmà nēkwu ezi-okwu nke kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi n’etiti ayi, ọ buru na ọ bughi dika okwu ahu nile si di, nke Jehova, bú Chineke-gi, gēzite gi ka i were ya biakute ayi, otú a ka ayi gēme.

6 Ma ọ di nma ma ọ jọrọ njọ, olu Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi gēge nti, bú Onye ayi onwe-ayi nēziga gi ijekuru; ka o we diri ayi nma, mb͕e ayi nēge nti olu Jehova, bú Chineke-ayi.

7 O rue, mb͕e ubọchi iri gwusiri, na okwu Jehova ruru Jeremaia nti.

8 O we kpọ Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha so ya, na ndi Israel nile site n’onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku,

9 si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, Onye unu zigaram ijekuru ime ka aririọ-amara-unu da n’iru Ya, siri:

10 Ọ buru na unu ebiri n’ala nka, M’gēwu kwa unu dika ulo, ghara ikwada unu, M’gāku kwa unu dika osisi, ghara iropu unu: n’ihi na echeghariwom n’ihe ọjọ ahu nke M’meworo unu.

11 Unu atula egwu eze Babilon, onye unu onwe-unu nātu egwu ya; unu atula egwu ya, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): n’ihi na unu ka M’nọyere, izọputa unu, na inaputa unu n’aka-ya.

12 M’gēnye kwa unu ka enwe obi-ebere nile n’aru unu, ka o we nwe obi-ebere n’aru unu, me ka unu lata n’ala-unu.

13 Ma ọ buru na unu onwe-unu asi, Ayi agaghi-ebi n’ala nka; unu ewe ghara ige nti olu Jehova, bú Chineke-unu;

14 si, É-è; kama ọ bu n’ala Ijipt ka ayi gābà, ebe ayi nāgaghi-ahu agha, ayi agaghi-anu kwa olu opì-ike, agu ihe-oriri agaghi-agu kwa ayi; ọ bu kwa n’ebe ahu ka ayi gēbi:

15 ma ub͕u a n’ihi nka nurunu okwu Jehova, unu ndi Juda fọduru: otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Ọ buru na unu onwe-unu edosie iru-unu ike ibà n’Ijipt, unu ewe ba inọ dika ọbìa n’ebe ahu;

16 ọ gēru kwa, na mma-agha ahu nke unu onwe-unu nātu egwu ya, n’ebe ahu ka ọ gēru unu aru n’ala Ijipt; ọzọ, oké unwu ahu, nke unu onwe-unu nātu egwu ya, n’ebe ahu ka ọ gārapara unu n’aru n’iso unu n’azu n’Ijipt; ọ bu kwa n’ebe ahu ka unu gānwu.

17 Ọ bu kwa otú a ka ndikom ahu nile gādi, bú ndi doworo iru-ha ibà n’Ijipt inọ dika ọbìa n’ebe ahu; ha gānwu site na mma-agha, na site n’oké unwu, na site n’ajọ ọria nēfe efe: ha agaghi-enwe kwa ndi fọduru ma-ọbu ndi b͕apuru ab͕apu n’iru ihe ọjọ ahu nke Mu onwem nēme ka ọ biakwasi ha.

18 N’ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri; Dika awukwasiworo iwem na ọnumam n’aru ndi bi na Jerusalem, otú a ka agāwukwasi ọnumam n’aru unu, mb͕e unu batara n’Ijipt: unu gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta; ma unu agaghi-ahu kwa ebe a ọzọ.

19 Jehova ekwuwo okwu bayere unu, unu ndi Juda fọduru, si, Unu abàla n’Ijipt: maranu nke-ọma na ab͕aworom unu àmà ta.

20 N’ihi na unu akpafuwo megide nkpuru-obi-unu; n’ihi na unu onwe-unu zigaram jekuru Jehova, bú Chineke-unu, si, Kpere ayi Jehova, bú Chineke-ayi, ekpere; ọzọ, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-ayi, gāsi, gi gosi ayi otú a, ayi gēme kwa ya:

21 m’we gosi unu ya ta; ma unu egeghi nti n’olu Jehova, bú Chineke-unu, ọbuná ime ihe ọ bula nke O zìrim ka m’were ya biakute unu.

22 Ma ub͕u a maranu nke-ọma na ọ bu site na mma-agha, na site n’oké unwu, na site n’ajọ ọria nēfe efe, ka unu gānwu n’ebe ahu nke ọ nātọ unu utọ ije nọ dika ọbìa n’ebe ahu.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 43

1 O rue, mb͕e Jeremaia gwabìri ndi Israel nile okwu nile nke Jehova, bú Chineke-ha, nke Jehova, bú Chineke-ha, zigara ya ka o were ha jekuru ha, bú okwu ndia nile,

2 Azaraia nwa Hoshaia, na Johanan nwa Karea, na ndi-nganga nile, we kwue, si Jeremaia, Okwu-ugha ka gi onwe-gi nēkwu: Jehova, bú Chineke-ayi, eziteghi gi isi, Unu abàla n’Ijipt inọ dika ọbìa n’ebe ahu:

3 kama Beruk nwa Neraia nākpali gi imegide ayi, ka o we nye ayi n’aka ndi Kaldea, ka ha we me ka ayi nwua, me kwa ka ayi je biri na Babilon.

4 Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha, na ndi Israel nile, we ghara ige nti olu Jehova, ibi n’ala Juda.

5 Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha, we chiri ndi Juda nile fọduru, bú ndi siri na mba nile ebe achugara ha-ri lata inọ dika ọbìa n’ala Juda;

6 bú ndikom, na ndinyom, na umu-ntakiri, na umu-ndinyom eze, na madu ọ bula nke Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ọ nọdu n’aka Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, na Jeremaia, bú onye-amuma, na Beruk nwa Neraia;

7 ha we ba n’ala Ijipt; n’ihi na ha egeghi nti olu Jehova: ha we biarue Tahpanhes.

8 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti na Tahpanhes, si,

9 Were nkume di uku n’aka-gi, zobe ha n’urọ n’ebe ahu anākpu brick nke di n’ọnu-uzọ ulo Fero na Tahpanhes, n’anya ndi Juda;

10 si ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M’gaje iziga kuru Nebukadreza, eze Babilon, bú orùm, dọkwasi oche-eze-ya n’elu nkume ndia nke m’zobeworo; ọ gēseti kwa ulo-ǹdò-ya n’elu ha.

11 Ọ gābia kwa, tib͕ue ala Ijipt; ndi diri ọnwu ka agēnye n’ọnwu, ndi diri ndọta-n’agha ka agēnye na ndọta-n’agha, ndi diri mma-agha ka agēnye na mma-agha.

12 M’gēsuye kwa ọku n’olu nile nke chi nile nke Ijipt; o gēsure kwa ha ọku, dọta ha n’agha: ọ gēji kwa ala Ijipt kpuchie onwe-ya dika onye-ọzùzù-aturu si eji uwe-ya kpuchie onwe-ya; o gēsi kwa n’ebe ahu pua n’udo.

13 O gētipia kwa ogidi nile nke ulo anyanwu, nke di n’ala Ijipt; ọ bu kwa ulo nile nke chi nile nke Ijipt ka ọ gēsure n’ọku.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 44

1 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti bayere ndi-Ju nile ndi bi n’ala Ijipt, ndi bi na Migdol, na nime Tahpanhes, na nime Nof, na n’ala Patros, si,

2 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Unu onwe-unu ahuwo ihe ọjọ ahu nile nke M’meworo ka ọ biakwasi Jerusalem, biakwasi kwa obodo nile nke Juda; ma, le, ha bu nkpọnkpọ ebe ta, ọ dighi kwa onye bi nime ha;

3 n’ihi ihe ọjọ ha nke ha meworo ikpasum iwe, n’ije isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ifè chi ọzọ di iche iche, ndi ha nāmaghi, ha onwe-ha, ma-ọbu unu onwe-unu, ma-ọbu nna-unu-hà.

4 M’we zitere unu ndi-orùm nile, bú ndi-amuma, nēbili n’isi-ututu nēzite ha, si, Biko, unu emela ihe-árú a nke M’kpọworo asì.

5 Ma ha anughi, ha atọghi kwa nti-ha n’ala isi n’ihe ọjọ ha chigharia, ighara isurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

6 Ewe wusi ọnumam na iwem, o we re ọku n’obodo nile nke Juda, na n’èzí nile nke Jerusalem; ha we ghọ nkpọnkpọ ebe, ebe tọb͕ọrọ n’efu, dika o si di ta.

7 Ma ub͕u a otú a ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: N’ìhi gini ka unu onwe-unu nēme ihe ọjọ di uku megide nkpuru-obi unu, ibipu n’ulo-unu nwoke na nwanyi na nwatakiri na nwa nāṅu ara, ka ha pua n’etiti Juda, ewe me ka ọ ghara idi ndi fọduru gāfọduru unu;

8 n’iji ọlu nile nke aka-unu kpasuem iwe, n’isurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ala Ijipt, ebe unu onwe-unu biaworo inọ dika ọbìa; ka ewe bipu unu, ka unu we ghọ kwa ihe-nkọcha na ihe-ita-uta n’etiti mba nile nke uwa?

9 Ùnu echezọwo ihe ọjọ nile nke nna-unu-hà, na ihe ọjọ nile nke ndi-eze Juda, na ihe ọjọ nile nke ndinyom-ha, na ihe ọjọ nile nke unu, na ihe ọjọ nile nke ndinyom-unu, nke ha mere n’ala Juda, na n’èzí nile nke Jerusalem?

10 Azọpiaghi ha n’obi rue ta, ha atughi kwa egwu, ha ejegharighi kwa n’iwum, na n’ukpurum nile, nke M’tiyere n’iru unu na n’iru nna-unu-hà.

11 N’ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Le, M’gaje ido irum imegide unu ime unu ihe ọjọ, ọbuná ibipu Juda nile.

12 M’gēwere kwa ndi Juda fọduru, bú ndi doworo iru-ha ibà n’ala Ijipt inọ dika ọbìa n’ebe ahu, agēme kwa ka ha nile gwusia; n’ala Ijipt ka ha gāda; site na mma-agha na site n’oké unwu ka agēme ka ha gwusia: ha gānwu, site n’onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku, site na mma-agha na site n’oké unwu: ha gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta.

13 M’gēji kwa nmehie nke ndi bi n’ala Ijipt leta ha, dika M’jiworo nmehie nke Jerusalem leta ya, site na mma-agha, na site n’oké unwu, na site n’ajọ ọria nēfe efe:

14 ọ gaghi-adi kwa onye-nb͕apu ma-ọbu onye fọduru afọdu ndi Juda fọduru gēnwe, bú ndi bataworo n’ala Ijipt inọ dika ọbìa n’ebe ahu, ọbuná ilaghachi n’ala Juda, nke ha onwe-ha nāchọ si-ike ilaghachi ibi n’ebe ahu: n’ihi na ọ dighi onye gālaghachi ma-ọbughi ndi b͕apuru ab͕apu.

15 Ndikom ahu nile ndi mara na ndinyom-ha nēsurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na ndinyom nile ndi nēguzo n’ebe ahu, ọ bu nkpọkọta di uku, ọbuná ndi Israel nile ndi bi n’ala Ijipt, nime Patros, ha we za Jeremaia, si,

16 Okwu ahu nke i gwaworo ayi n’aha Jehova, ayi agaghi-adi nēge gi nti.

17 Kama ayi aghaghi ime okwu nile ọ bula nke puworo n’ọnu-ayi, isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu, dika ayi meworo, ayi onwe-ayi, na nna-ayi-ha, na ndi-eze-ayi, na ndi-isi-ayi, n’obodo nile nke Juda, na n’èzí nile nke Jerusalem: ayi we rijue nri afọ, aru adi ayi nma, ọ dighi kwa ihe ọjọ ayi huru.

18 Ma site na mb͕e ayi rapuru isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu, ihe nile akọwọ ayi, ọ bu kwa site na mma-agha na site n’oké unwu ka emeworo ka ayi gwusia.

19 Ma mb͕e ayi onwe-ayi nēsurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nāwusi-kwa-ra ya àjà-ihe-ọṅuṅu, ọ̀ bu mb͕e di-ayi nēkweghi ka ayi meworo ob͕e achicha nye ya ime onyinyo-ya, wusi-kwa-ra ya àjà-ihe-ọṅuṅu?

20 Jeremaia we gwa ndi Israel nile, ma ndikom ma ndinyom, ọbuná ndi Israel nile ndi nāza ya okwu, si,

21 Ọ̀ bughi ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ nke unu surere n’obodo nile nke Juda na n’èzí nile nke Jerusalem, unu onwe-unu, na nna-unu-hà, na ndi-eze-unu, na ndi-isi-unu, na ndi ala ahu, ọ̀ bughi ihe ndia ka Jehova chetara, ihe ahu we bata n’obi-Ya?

22 Jehova apughi kwa inagide kwa ọzọ, n’ihi ihe ọjọ nke omume nile unu, n’ihi ihe-árú nile nke unu meworo; ala-unu we ghọ nkpọnkpọ ebe, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, ghara inwe onye-obibi, dika o si di ta.

23 N’ihi na unu esurewo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na n’ihi na unu emehiewo megide Jehova, we ghara ige nti olu Jehova, ghara kwa ijeghari n’iwu-Ya, na n’ukpuru-Ya nile, na n’ihe-àmà-Ya nile; n’ihi nka ka ihe ọjọ a dakwasiworo unu, dika o si di ta.

24 Jeremaia we si ndi Israel nile, si kwa ndinyom ahu nile, Nurunu okwu Jehova, unu Juda nile ndi nọ n’ala Ijipt:

25 otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru, si: Unu onwe-unu na ndinyom-unu ji ọnu-unu ekwu okwu, ọ bu kwa aka-unu ka unu jiworo mezu ya, si, Ayi aghaghi ime nkwa nile ayi nke ayi kweworo, isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu: menu ka nkwa nile unu guzosie ike n’ezie, me-kwa-nu ihe nile unu kwere na nkwa n’ezie.

26 N’ihi nka nurunu okwu Jehova, unu Juda nile ndi bi n’ala Ijipt: Le, Mu onwem ewerewo aham di uku ṅua iyi, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na aham agaghi-abu kwa ọzọ ihe anākpọ n’ọnu onye ọ bula nke Juda n’ala Ijipt nile, si, Onye-nwe-ayi Jehova nādi ndu.

27 Le, Mu nāmu anya n’aru ha ime ha ihe ọjọ, ọ bughi ime ha nma: agēme kwa ka ndi Juda nile, bú ndi nọ n’ala Ijipt, gwusia site na mma-agha na site n’oké unwu, rue mb͕e ha gāgwusi.

28 Ma ndi b͕apuworo na mma-agha gēsi n’ala Ijipt laghachi n’ala Juda, ndikom ole-na-ole; ndi Juda nile fọduru, bú ndi biaruworo ala Ijipt inọ dika ọbìa n’ebe ahu, ewe mara onye okwu-ya gēguzosi ike, nkem, ma-ọbu nke ha.

29 Ma nka gāburu unu ihe-iriba-ama, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na Mu onwem nēji nmehie-unu leta unu n’ebe a, ka unu we mara na okwum nile aghaghi iguzosi ike imegide unu ime unu ihe ọjọ:

30 otú a ka Jehova siri: Le, M’gaje inye Fero Họfra, bú eze Ijipt, n’aka ndi-iro-ya, na n’aka ndi nāchọ ndu-ya; dika M’nyere Zedekaia, bú eze Juda, n’aka Nebukadreza, bú eze Babilon, bú onye-iro-ya, nke nāchọ kwa ndu-ya.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 45

1 Okwu ahu nke Jeremaia, bú onye-amuma, gwara Beruk nwa Neraia, mb͕e o dere okwu ndia n’akwukwọ site n’ọnu Jeremaia, n’arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, si,

2 Okwu di otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, kwuru bayere gi, Beruk, si:

3 I siri, Biko, ahuhu nādirim! n’ihi na Jehova atukwasiwo ihe-nwuta n’elu ihe-nb͕um; adọb͕uwom onwem n’ọlu n’ize-umem, ma achọtaghm izu-ike.

4 Otú a ka i gāsi ya, Otú a ka Jehova siri: Le, ihe nke M’wuworo ka Mu onwem nākwada, ọzọ, ihe nke M’kuworo n’ubi ka Mu onwem nēropu; ọbuná ala nka nile, nkem ka ọ bu.

5 Ma gi onwe-gi, ì nāchọrọ onwe-gi ihe uku? achọla ha: n’ihi na, le, M’gaje ime ka ihe ọjọ biakwasi anu-aru nile, bú madu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): ma M’gēnye gi ndu-gi ka ọ buru ihe-nkwata n’ebe nile i gēje.