Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 26

1 Na nmalite nke ọbubu-eze Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, ka okwu a sitere na Jehova, si,

2 Otú a ka Jehova siri: Guzo n’ogige ulo Jehova, gwa obodo nile nke Juda, bú ndi nābia ikpọ isi ala n’ulo Jehova, okwu nile nke M’nyere gi n’iwu igwa ha; agubìla otù nime ha.

3 Eleghi anya ha gānu, we lata, onye ọ bula o si n’uzọ ọjọ ya lata; ka M’we chègharia n’ihe ọjọ ahu nke Mu onwem nēchè ime ha n’ihi ihe ọjọ nke omume nile ha.

4 I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na unu egeghm nti, ijehari n’iwum nke M’tiyeworo n’iru unu,

5 ige nti okwu nile nke ndi-orùm, bú ndi-amuma, ndi Mu onwem nēzitere unu, nēbili kwa n’isi-ututu nēzite ha, ma unu egeghi nti;

6 M’gēme kwa ka ulo a di ka Shailo, ọ bu kwa obodo a ka M’gēme ka ọ ghọrọ mba nile nke uwa ihe-nkọcha.

7 Ndi-nchu-àjà na ndi-amuma na ndi Israel nile we nu ka Jeremaia nēkwu okwu ndia n’ulo Jehova.

8 O rue, mb͕e Jeremaia kwubìri okwu nile nke Jehova nyere ya n’iwu igwa ndi Israel nile, na ndi-nchu-àjà na ndi-amuma na ndi Israel nile jidere ya, si, I ghaghi inwu anwu.

9 Gini mere i buworo amuma n’aha Jehova, si, Ulo a gādi ka Shailo, obodo a gābu kwa nkpọnkpọ ebe, ghara inwe onye-obibi? Ewe kpọkọta ndi Israel nile n’ebe Jeremaia nọ n’ulo Jehova.

10 Ndi-isi Juda we nu ihe ndia, ha we si n’ulo eze rigota n’ulo Jehova; ha we nọdu ala n’oghere ọnu-uzọ-ama ọhu nke ulo Jehova.

11 Ndi-nchu-àjà na ndi-amuma we gwa ndi-isi na ndi Israel nile okwu, si, Ikpé ọnwu kwesiri nwoke a; n’ihi na o buwo amuma megide obodo a, dika unu jiworo nti-unu nu.

12 Jeremaia we gwa ndi-isi nile, gwa ndi Israel nile, okwu, si, Jehova ziterem ibu amuma okwu nile nke unu nuworo megide ulo a na imegide obodo a.

13 Ma ub͕u a menu ka uzọ nile unu na omume nile unu di nma, ge-kwa-nu nti olu Jehova, bú Chineke-unu; Jehova gēchèghari kwa n’ihe ọjọ ahu nke O kwuworo megide unu.

14 Ma mu onwem, le, adim n’aka-unu: menum ka o si di nma na ka o si zie ezie n’anya-unu.

15 Nání, maranu nke-ọma na, ọ buru na unu eme ka m’nwua, ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ ka unu onwe-unu nātukwasi n’aru unu, na n’aru obodo a, na n’aru ndi bi ya: n’ihi na n’ezi-okwu Jehova ezitewom ibiakute unu ikwu okwu ndia nile na nti-unu.

16 Ndi-isi na ndi Israel nile we si ndi-nchu-àjà, si kwa ndi-amuma, Ọ dighi ikpé ọnwu kwesiri nwoke a; n’ihi na ọ bu n’aha Jehova, bú Chineke-ayi, ka gwaworo ayi okwu.

17 Ufọdu nime ndi-okenye ala we bilie, gwa nkpọkọta ahu nile nke ndi Israel okwu, si,

18 Maika onye Moreshet nēburi amuma n’ubọchi Hezekaia, bú eze Juda; o we gwa ndi Juda nile okwu, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Agēji ploughi gwu Zaion dika ubi, Jerusalem gāghọ kwa obo-ihe obo-ihe, ugwu nke ulo ahu gādi kwa ka ebe di elu nke oké ọhia.

19 Hezekaia, bú eze Juda, na Juda nile, hà mere ya ka ọ nwua ma-ọli? ọ̀ tughi egwu Jehova, we chọ ka iru Jehova dajua, Jehova we chègharia n’ihe ọjọ ahu nke O kwururi megide ha? Ma ayi onwe-ayi nēme ihe ọjọ di uku megide nkpuru-obi-ayi.

20 Ọzọ kwa, otù nwoke di nke nēbu amuma n’aha Jehova, bú Uraia nwa Shemaia nke sitere na Kiriat-jearim; o we bue amuma megide obodo a, megide kwa ala nka, dika okwu nile nke Jeremaia si di:

21 Jehoiakim, bú eze, na ndi-dikei ya nile, na ndi-isi nile, we nu okwu-ya nile, eze we chọ ime ka ọ nwua; Uraia we nu ya, tua egwu, b͕alaga, we ba n’Ijipt:

22 Jehoiakim, bú eze, we ziga ndikom n’Ijipt, bú Elnetan nwa Akboa, na ndikom ufọdu so ya, ijeru Ijipt:

23 ha we me ka Uraia si n’Ijipt puta, ha we me ka ọ biakute eze, bú Jehoiakim; o we were mma-agha tibue ya, tubà ozu-ya n’ílì umu ndi Israel.

24 Ma otú ọ di, aka Ahaikam nwa Shefan di n’akuku Jeremaia, ka ha we ghara inye ya n’aka ndi Israel ime ka ọ nwua.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 27

1 Na nmalite ọbubu-eze Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, ka okwu a ruru Jeremaia nti site na Jehova, si,

2 Otú a ka Jehova sirim: Mere onwe-gi ab͕u di iche iche na nkpọrọ di iche iche, tukwasi ha n’olu-gi;

3 chiri ha zigara eze Edom, ziga-kwa-ra eze Moab, ziga-kwa-ra eze umu Amon, ziga-kwa-ra eze Taia, ziga-kwa-ra eze Zaidon, site n’aka ndi-ozi ndi nābiaru Jerusalem nābiakute Zedekaia, bú eze Juda;

4 nye ha iwu inye ndi-nwe-ha, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Otú a ka unu gāsi ndi-nwe-unu;

5 Mu onwem emewo uwa, na madu na anumanu nke di n’elu uwa, site n’ikem di uku, site kwa n’ogwe-akam nke eseteri eseti; ewerewokwam ya nye onye o ziri ezi n’anyam inye.

6 Ma ub͕u a Mu onwem enyewo ala nile ndia n’aka Nebukadneza, bú eze Babilon, bú orùm; ọzọ kwa, anu ọhia ka M’nyeworo ya ifè ya.

7 Mba nile gēfè kwa ya na nwa-ya na nwa nwa-ya òfùfè rue mb͕e mb͕e ala-ya biara: mb͕e ahu ya onwe-ya ka ọtutu mba na ndi-eze nke di uku gēme ka ọ fè ha òfùfè.

8 O gēru kwa, na mba ahu na ala-eze ahu nke nāgaghi-efè onye ahu, bú Nebukadneza eze Babilon, nke nāgaghi-etiye kwa olu-ya na yoke nke eze Babilon, M’gēji mma-agha, ji kwa oké unwu, ji kwa ajọ ọria nēfe efe, leta mba ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), rue mb͕e M’mere ka ha gwusia site n’aka-ya.

9 Ma unu onwe-unu, unu egela ndi-amuma-unu nti, ege-kwa-la ndi-unu nāju arusi ase, ege-kwa-la nrọ nile unu, ege-kwa-la ndi-unu nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, ege-kwa-la ndi-mb͕asi-unu, ndi nāgwa unu okwu, si, Unu agaghi-efe eze Babilon:

10 n’ihi na amuma ugha ka ndi ahu nēburu unu, ime ka unu si n’ala-unu je n’ebe di anya: ka M’we chupu kwa unu, unu ewe la n’iyì.

11 Ma mba ahu nke gēme ka olu-ya ba na yoke nke eze Babilon, nke gēfe kwa ya, M’gēkwe kwa ka mba ahu nọdu n’elu ala-ya, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); ha gālu kwa ya, biri kwa nime ya.

12 Ọ bu kwa Zedekaia, bú eze Juda, ka m’gwara okwu dika okwu nile ndia si di, si, Menu ka olu-unu ba na yoke nke eze Babilon, fè-kwa-nu ya na ndi-ya, we di ndu.

13 N’ìhi gini ka unu gānwu, gi onwe-gi na ndi-gi, site na mma-agha, na site n’oké unwu, na site n’ajọ ọria nēfe efe, dika Jehova kwuworo bayere mba ahu nke nāgaghi-efe eze Babilon?

14 Ma unu egela nti okwu nile nke ndi-amuma ndi nāgwa unu okwu, si, Unu agaghi-efé eze Babilon: n’ihi na amuma ugha ka ha nēburu unu.

15 N’ihi na eziteghm ha, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ma ha onwe-ha nēbu amuma ugha n’aham; ka M’we chupu unu, unu ewe la n’iyì, unu onwe-unu na ndi-amuma ndi nēburu unu amuma.

16 Ọ bu kwa ndi-nchu-àjà na ndi nka nile ka m’gwara okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Unu egela nti okwu nile nke ndi-amuma-unu ndi nēburu unu amuma, si, Le, agaje isi na Babilon welata ihe nile nke ulo Jehova ub͕u a ngwa ngwa: n’ihi na amuma ugha ka ndi ahu nēburu unu.

17 Unu egela ha nti; fènu eze Babilon, we di ndu: n’ìhi gini ka obodo a gāghọ nkpọnkpọ ebe?

18 Ma ọ buru na ndi-amuma ka ha bu, ọ buru na okwa na okwu Jehova di ha n’ọnu, biko, ka ha riọ Jehova nke usu nile nke ndi-agha aririọ, ka ihe nile nke fọduru n’ulo Jehova, na n’ulo eze Juda, na nime Jerusalem, we ghara ibà na Babilon.

19 N’ihi na okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru bayere ogidi nile, baye-kwa-ra oké osimiri ahu, baye-kwa-ra ihe-ndọkwasi nile, baye-kwa-ra ihe fọduru, bú nke fọduru n’obodo a,

20 nke Nebukadneza, bú eze Babilon, nāchighi, mb͕e o mere ka Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, si na Jerusalem je biri na Babilon, ya na ndi Juda na Jerusalem nile amara aha-ha;

21 e, okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Irael, kwuru bayere ihe nile fọduru n’ulo Jehova na n’ulo eze Juda, na nime Jerusalem, si:

22 na Babilon ka agēbubà ha, ọ bu kwa n’ebe ahu ka ha gādi, rue ubọchi M’gēleta ha, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); mb͕e ahu ka M’gēbugota ha, bulata n’ebe a.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 28

1 O rue, n’arọ ahu, na nmalite ọbubu-eze Zedekaia, bú eze Juda, n’arọ nke-anọ, n’ọnwa nke-ise, na Hananaia nwa Azua, bú onye-amuma, nke sitere na Gibeon, gwaram okwu n’ulo Jehova, n’anya ndi-nchu-àjà na ndi Israel nile, si,

2 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru, si, Ab͕ajiwom yoke nke eze Babilon.

3 Tutu ogologo arọ abua eruzue Mu onwem ganēbulata nēbe a ihe nile nke ulo Jehova, nke Nebukadneza, bú eze Babilon, siri n’ebe a bupu, we bubà ha na Babilon:

4 ọzọ, Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, na ndi Juda nile emere ka ha je biri n’ala ọzọ, bú ndi bàworo na Babilon, ndia ka Mu onwem gaje ime ka ha lata n’ebe a, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): n’ihi na M’gab͕aji yoke nke eze Babilon.

5 Jeremaia, bú onye-amuma, we si Hananaia, bú onye-amuma, n’anya ndi-nchu-àjà, na n’anya ndi Israel nile ndi nēguzo n’ulo Jehova,

6 o we si, bú Jeremaia onye-amuma, Amen: Jehova me otú a: Jehova me ka okwu-gi nile guzosie ike, bú nke i buworo amuma, ime ka ihe nile nke ulo Jehova, na ndi nile emere ka je biri n’ala ọzọ, si na Babilon lata n’ebe a.

7 Nání, biko, nuru okwua nke mu onwem nēkwu na nti-gi abua, na na nti ndi nka nile:

8 Ndi-amuma ndi burum uzọ, ndi buru kwa gi uzọ, site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ha we bue amuma megide ọtutu ala, megide kwa ala-eze uku di iche iche, bayere agha, baye-kwa-ra ihe ọjọ, baye-kwa-ra ajọ ọria nēfe efe.

9 Onye-amuma nke nēbu amuma bayere udo, mb͕e okwu onye-amuma ahu gērè, agāmara onye-amuma ahu, na Jehova ezitewo ya n’ezie.

10 Hananaia, bú onye-amuma, we kopu nkpọrọ ahu n’olu Jeremaia, bú onye-amuma, we b͕ajie ya.

11 Hananaia we kwue okwu n’anya ndi Israel nile, si, Otú a ka Jehova siri: Ọbuná otú a ka M’gāb͕ajipu yoke nke Nebukadneza, bú eze Babilon, n’olu mba nile tutu ogologo arọ abua eruzue. Jeremaia, bú onye-amuma, we la.

12 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, mb͕e Hananaia, bú onye-amuma, b͕ajipusiri nkpọrọ n’olu Jeremaia, bú onye-amuma, si,

13 Je, gwa Hananaia okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Nkpọrọ osisi ka i b͕ajiworo; ma i mewo nkpọrọ ígwè n’ọnọdu ha.

14 N’ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Yoke nke ígwè ka M’tukwasiworo n’olu mba nile ndia, ka ha we fè Nebukadneza, bú eze Babilon; ha gēfè kwa ya: ọzọ, anu ọhia ka M’nyeworo ya.

15 Jeremaia, bú onye-amuma, we si Hananaia, bú onye-amuma, Biko, nuru, Hananaia; Jehova eziteghi gi; ma gi onwe-gi emewo ka ndi nka tukwasi okwu-ugha obi.

16 N’ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M’gaje isi n’elu uwa zilaga gi: n’arọ a ka gi onwe-gi gānwu, n’ihi na okwu nwezuga ka i kwuworo megide Jehova.

17 Hananaia, bú onye-amuma, we nwua n’arọ ahu n’ọnwa nke-asa.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 29

1 Ma ndia bu okwu nke akwukwọ ahu nke Jeremaia, bú onye-amuma, si na Jerusalem zigara ndi-okenye fọduru nime ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, nke o ziga-kwa-ra ndi-nchu-àjà, ziga-kwa-ra ndi-amuma, ziga-kwa-ra ndi Israel nile, ndi Nebukadneza mere ka ha si na Jerusalem je biri na Babilon:

2 (mb͕e Jekonaia, bú eze, na eze-nwanyi, na ndi-onozi, na ndi-isi Juda na Jerusalem, na ndi-ọ̀kà, na ndi-uzú, pusiri na Jerusalem;)

3 site n’aka Elasa nwa Shefan, na Gemaraia nwa Hilkaia, (ndi Zedekaia, bú eze Juda, zigara Nebukadneza, bú eze Babilon, rue Babilon,) si,

4 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri ndi nile emere ka ha je biri n’ala ọzọ, bú ndi M’meworo ka eme ka ha si na Jerusalem je biri na Babilon:

5 Wuenu ulo, biri; kukwa-nu ihe n’ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha;

6 luanu nwunye, mua umu-ndikom na umu-ndinyom; lu-kwa-ranu umu-unu ndikom nwunye, lu-kwa-ranu umu-unu ndinyom di, ka ha we mua umu-ndikom na umu-ndinyom; ba-kwa-nu uba n’ebe ahu, ghara ibilata.

7 Chọ-kwa-nu udo nke obodo ahu nke M’meworo ka eme ka unu je biri n’ebe ahu, kpe-kwa-ranu Jehova ekpere bayere ya: n’ihi na n’udo-ya ka udo gādiri unu.

8 N’ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Unu ekwela ka ndi-amuma-unu ndi nọ n’etiti unu, na ndi-unu ndi nāju arusi ase, rafue unu, unu ege-kwa-la nti nrọ nile unu nke unu onwe-unu nēme ka arọ ha.

9 N’ihi na amuma ugha ka ndi ahu nēburu unu n’aham: eziteghm ha; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

10 N’ihi na otú a ka Jehova siri, Mb͕e ọgu arọ atọ na iri ruzuru nye Babilon, M’gēleta unu, me ka ezi okwum ahu guzosiere unu ike, n’ime ka unu lata n’ebe a.

11 N’ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n’iru na ntukwasi-obi.

12 Unu gākpọkukwam, je kperem ekpere, M’gēge kwa unu nti.

13 Unu gāchọsikwam ike, we chọtam, mb͕e unu ji obi nile unu achọm.

14 M’gēkwe kwa ka unu chọtam, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), M’gēme kwa ka ndi-unu adọtara n’agha lata, M’gēsi kwa na mba nile, na n’ebe nile M’chugaworo unu, chikọta unu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); M’gēme kwa ka unu lata n’ebe ahu nke M’mere ka unu si n’ebe ahu je biri n’ala ọzọ.

15 N’ihi na unu asiwo, Jehova emewo ka ndi-amuma biliere ayi nime Babilon.

16 N’ihi na okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere eze ahu nke nānọkwasi n’oche-eze Devid, baye-kwa-ra ndi nka nile nke bi n’obodo a, bú umu-nne-unu ndi nēsoghi unu pua ije n’ala ọzọ ebe emere ka unu je biri;

17 otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Le, M’gaje iziga n’etiti ha mma-agha, na oké unwu, na ajọ ọria nēfe efe, M’gēme kwa ha ka ha di ka fig jọb͕uru onwe-ha, nke anāgaghi-eri eri, site n’ijọ-njọ-ha.

18 M’gēji kwa mma-agha, ji kwa oké unwu, ji kwa ọria nēfe efe, chuso ha, M’gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, ibu ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ibu ihe-iju-anya, na ibu ihe-ima-ọsọ, na ibu ihe-ita-uta, n’etiti mba nile ebe M’chugaworo ha:

19 n’ihi na ha egeghi nti okwum nile, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), nke M’zigara ha ndi-orùm, bú ndi-amuma, igwa ha, nēbili n’isi-ututu nēziga ha; ma unu egeghi nti; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

20 Ma unu onwe-unu, nurunu okwu Jehova, unu ndi nile emere ka unu je biri n’ala ọzọ, ndi M’zigara si na Jerusalem rue Babilon.

21 Okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru bayere Ehab nwa Kolaia, baye-kwa-ra Zedekaia nwa Maaseia, ndi nēburu unu amuma ugha n’aham, si: Le, M’gaje inye ha n’aka Nebukadreza, bú eze Babilon; o gētib͕u kwa ha n’anya-unu;

22 agēsite kwa na ha bulie nkọcha, nke ndi Juda nile emere ka ha je biri n’ala ọzọ ndi nọ na Babilon gēji kọcha, si, Jehova me gi ka i di ka Zedekaia na dika Ehab, ndi eze Babilon rub͕uru n’ọku:

23 n’ihi na ha emewo ihe-nzuzu n’Israel, we kwa nwunye ndikom-ibe-ha iko, kwu kwa okwu n’aham n’ugha, bú nke M’nēnyeghi ha n’iwu; ma Mu onwem bu onye mara, na onye-àmà; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

24 Ọzọ, okwu bayere Shemaia, bú onye-Nehelamait, ka i gēkwu, si,

25 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru, si, N’ihi na gi onwe-gi ezigaworo ndi nka nile ndi bi na Jerusalem, ziga-kwa-ra Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, ziga-kwa-ra ndi-nchu-àjà nile, akwukwọ n’aha-gi, si,

26 Jehova emewo gi onye-nchu-àjà n’ọnọdu Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, ka ndi-nlekọta we di n’ulo Jehova, imeso onye ọ bula nāwi ara, nke nēme kwa onwe-ya onye-amuma, ka i we tiye ya n’ọtọsi na nime nkpọrọ olu.

27 Ma ub͕u a, n’ìhi gini ka i nābasighi Jeremaia onye Anatot nba ike, onye nēme onwe-ya onye-amuma n’ebe unu nọ,

28 n’ihi na o ziteworo ayi ozi na Babilon, si, Mb͕e unu gēbi n’ala ọzọ di anya: wuenu ulo, biri; kuanu ihe n’ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha?

29 Zefanaia, bú onye-nchu-àjà, we gua akwukwọ a na nti Jeremaia, bú onye-amuma.

30 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si,

31 Zigara ndi nile emere ka ha je biri n’ala ọzọ, si, Okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere Shemaia onye-Nehelamait, si: N’ihi na Shemaia ebuworo unu amuma, ma Mu onwem eziteghi ya, o we me ka unu tukwasi okwu-ugha obi;

32 N’ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M’gaje iji nmehie Shemaia onye-Nehelamait leta ya, leta kwa nkpuru-ya; ọ gaghi-enwe nwoke ọ bula nēbi n’etiti ndi nka, ọ gaghi-elekwasi kwa ezi ihe ahu anya, bú nke Mu onwem nēmere ndim, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): n’ihi na okwu nwezuga ka o kwuworo megide Jehova.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 30

1 Okwu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, si,

2 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, kwuru, si, Dere onwe-gi n’akwukwọ okwu nile nke M’gwaworo gi.

3 N’ihi na, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), mb͕e M’gēme ka ndim lata, bú Israel na Juda, ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); M’gēme kwa ka ha lata n’ala ahu nke M’nyere ndi bu nna-ha, ha gēnweta kwa ya.

4 Ma ndia bu okwu nke Jehova kwuru bayere Israel, baye-kwa-ra Juda.

5 N’ihi na otú a ka Jehova siri: Olu nke ọma-jijiji ka ayi nuworo; egwu di, ma udo adighi.

6 Biko, juanu, hu ma ime nēme nwoke: gini mere M’huworo ndikom nile n’otù ka aka-ha di n’úkwù-ha, dika nwanyi ime nēme, iru nile ab͕anwewo kwa we di ka nke ozu?

7 Éwù! n’ihi na ub͕ochi ahu di uku, ọ dighi kwa ubọchi nke di ka ya: ọbuná mb͕e ahuhu ka ọ buru Jekob; ma agēsi nime ya zọputa ya.

8 Ọ gēru kwa n’ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), na M’gāb͕ajipu yoke-ya n’olu-gi, ọ bu kwa ab͕u-gi nile ka M’gētibì; ndi ala ọzọ agaghi-eme kwa ka ọ fè ha òfùfè ọzọ:

9 ma ha gēfè Jehova, bú Chineke-ha, na Devid, bú eze-ha, onye M’gēme ka o biliere ha.

10 Ma gi onwe-gi, atula egwu, gi orùm, bú Jekob, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); atu-kwa-la ujọ, gi Israel: n’ihi na, le, M’gaje izọputa gi n’ebe di anya, zọputa kwa nkpuru-gi n’ala ọzọ ebe emere ka ha je biri; Jekob gālata kwa, nọ jū n’aru bū, ọ dighi kwa onye ganēme ka ọ ma jijiji.

11 N’ihi na gi ka M’nọyere, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), izọputa gi: n’ihi na M’gēme ka mba nile gwusia, bú ebe M’chusaworo gi, ma otú ọ di, gi ka M’nāgaghi-eme ka i gwusia: ma M’gādọ gi aka na nti n’ikpé, M’gaghi-asi kwa na i bu onye ikpe nāmaghi ma-ọli.

12 N’ihi na otú a ka Jehova siri, Ihe nādighi ngwọta ka nb͕aji aka na ukwu gi bu, ọnyá-gi etiputara etiputa jọrọ njọ.

13 Ọ dighi onye nēkpe ọnu-gi: ọ dighi ọgwu ntechi i nwere.

14 Ndi nile ndi nāhu gi n’anya echezọwo gi; ha adighi-achọ gi: n’ihi na otiti nke onye-iro, bú idọ-aka-na-nti nke onye nēnweghi obi-ebere, ka M’wereworo tie gi; n’ihi iba-uba nke ajọ omume-gi, n’ihi na nmehie-gi nile nwere ume.

15 Gini mere i ji ti nkpu bayere nb͕aji aka na ukwu gi? ihe nādighi ngwọta ka ihe-nb͕u-gi bu: n’ihi iba-uba nke ajọ omume-gi, n’ihi na nmehie-gi nile nwere ume, ka M’meworo gi ihe ndia.

16 N’ihi nka agēripia ndi nile nēripia gi; ọzọ, ndi nile ndi nākpab͕u gi, ha nile, na ndọta-n’agha ka ha gāla; ndi nāpunara gi ihe gāghọ ihe apunaraworo n’aka madu, ọ bu kwa ndi nile nke nāluta ihe-gi n’agha ka M’gēnye ka ha ghọ ihe-nluta-n’agha.

17 N’ihi na M’gēme ka anu-aru ọhu puchie n’aru gi, M’gāgwọpu kwa gi n’ọnyá-gi nile etiputara, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); n’ihi na Nwanyi achupuru achupu ka ha kpọworo gi, si, Zaion ka ọ bu, ọ dighi onye nāchọ ya.

18 Otú a ka Jehova siri: Le, M’gaje ime ka ulo-ikwū nile nke Jekob adọtara n’agha lata, ọ bu kwa n’aru ebe-obidi-ya nile ka M’gēnwe obi-ebere; agēwu kwa obodo n’elu obo-ya, agēbi kwa n’ulo-elu-ya dika esiri ebi ya.

19 Ekele na olu nke ndi-ngwuri gēsi kwa nime ha puta: M’gēme kwa ka ha ba uba, ha agaghi-adi kwa ole-na-ole; M’gēme kwa ka ha di nsọpuru ha agaghi-adi kwa ntà.

20 Umu-ha gādi kwa ka ha si di na mb͕e ochie, nzukọ-ha gēguzosi kwa ike n’irum, M’gēji kwa nmehie nke ndi nile nēmeb͕u ya leta ha.

21 Ọzọ, onye-ebube nke Jekob gābu onye sitere na ya, onye nāchi ya gēsi kwa n’etiti ya puta; M’gēme kwa ka ọ biarue nso, o we biakutem nso: n’ihi na ònye ka onye a bu nke nọworo obi-ya mbé ibiakutem nso? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

22 Unu gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra unu Chineke.

23 Le, oké ifufe nke Jehova, bú ọnuma-Ya, apuwo, ọ bu oké ifufe nke nēfechapu efechapu: n’isi ndi nēmebi iwu ka ọ gēfekwasi si-ike.

24 Iwe di ọku nke Jehova agaghi-alaghachi azu, rue mb͕e O mesiri, ru kwa mb͕e O mesiri ka nzube nile nke obi-Ya guzosie ike: na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia ka unu gāghọta ya.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 31

1 Na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), M’gāburu ab͕uru nile nke Israel Chineke, ndi ahu gābu-kwa-ram otù ndi.

2 Otú a ka Jehova siri, Ndi siri na mma-agha fọdu hutara amara n’ọzara; mb͕e M’jere ime ka o nwe ọnọdu, bú Israel.

3 Site n’ebe di anya ka Jehova mere ka m’hu Ya, si, Ọ bu ihu-n’anya nke di mb͕e ebighi-ebi ka M’jiworo hu gi n’anya: n’ihi nka ka M’meworo ka ebere digidere gi.

4 M’gēwu kwa gi ọzọ dika ulo, ewe wu gi, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú Israel: agēji kwa egwú-otiti-gi nile chọ gi nma ọzọ, i gēso kwa otite-egwú nke ndi nēgwuri egwú pua.

5 I gāku kwa ubi-vine ọzọ n’elu ugwu nile nke Sameria: ndi nāku vine gāku, me ka ha pua na nsọ anāsọ ha.

6 N’ihi na otù ubọchi gādi mb͕e ndi-nche ndi nọ n’ugwu Efraim gākpọ, si, Bilienu, ka ayi rigorue Zaion jekuru Jehova, bú Chineke-ayi.

7 N’ihi na otú a ka Jehova siri, Werenu ọṅù tiere Jekob nkpu ọṅù, tisi-kwa-nu nkpu ike n’isi mba nile: menu ka anuru ya, tonu, si-kwa-nu, Jehova, zọputa ndi-Gi, bú Israel fọduru.

8 Le, M’gaje ime ka ha si n’ala Ugwu bia, M’gāchikọputa kwa ha na nsọtu nile nke uwa, n’etiti ha ka onye-ìsì na onye-ngwurọ na nwanyi di ime na nwanyi ime nēme gānọ n’otù: na nkpọkọta uku ka ha gālata n’ebe a.

9 N’ikwa-ákwá ka ha gābia, ọ bu kwa n’aririọ-amara nile ka M’gēduru ha: M’gēme ka ha jerue iyi di iche iche juputara na miri, n’uzọ ziri ezi, nke ha nāgaghi-asu ngọngọ nime ya: n’ihi na aghọworom Israel nna, ma Efraim, ọkparam ka ọ bu.

10 Nurunu okwu Jehova, unu mba nile, gosi-kwa-nu ya n’agwe-etiti nile di n’ebe di anya; si-kwa-nu, Onye nēfesa Israel gāchikọta ya, debe kwa ya, dika onye-ọzùzù-aturu si emere ìgwè aturu-ya.

11 N’ihi na Jehova ab͕aputawo Jekob, me ka ọ pua n’aka onye dikariri ya ike nwere onwe-ya.

12 Ha gābia kwa, tie nkpu ọṅù n’ebe di elu nke Zaion, rùba dika osimiri rue ezi ihe Jehova, rue ọka, ru kwa manya-vine, ru kwa manu, ru kwa umu ìgwè ewu na aturu na nke ìgwè ehi: nkpuru-obi-ha gādi kwa ka ubi ab͕ara ogige nke dere miri nke-ọma; ha agaghi-eru kwa újú ọzọ ma-ọli.

13 Mb͕e ahu ka nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke gāṅuri ọṅu n’otite-egwú, umu-okorọbia na ndi-okenye gāṅuri kwa ọṅu n’otù: n’ihi na M’gāb͕anwe oruru-újú-ha n’obi-utọ, kasi kwa ha obi, me ka ha si na nwuta-ha ṅuria ọṅu.

14 M’gēme kwa ka afọ abuba jubiga nkpuru-obi ndi-nchu-àjà ókè, afọ ezi ihem gēju kwa ndim; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

15 Otú a ka Jehova siri: Olu nime Rema ka anuru, bú abù-ákwá, na ikwa-ákwá nēlu ilu nke-uku, Rechel nākwara umu-ya ákwá; ọ juwo na agaghi-akasi ya obi bayere umu-ya, n’ihi na ha adighi.

16 Otú a ka Jehova siri: Jide olu-gi ka ọ ghara ikwa ákwá, jide kwa anya-gi abua ka ha ghara ib͕a anya-miri: n’ihi na ugwọ-ọlu di agākwu gi n’ọlu-gi, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): ha gēsi kwa n’ala onye-iro lata.

17 Olile-anya di-kwa-ra ọdi-n’iru-gi, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); umu-gi gālata kwa n’ókè-ala-ha.

18 Anuchasiwom ka Efraim nēgosi onwe-ya ebere o nwere n’aru onwe-ya otú a, si, I dọwom aka na nti, ewe dọm aka na nti, dika nwa-ehi nke anēmeghi ka ọ muta ọlu-ya: chighariam, m’we chigharia onwem; n’ihi na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chinekem.

19 N’ezie mb͕e m’chigharisiri, m’we chegharia: ọzọ, mb͕e emesiri ka m’mara, m’we tie aka n’apata-ukwum; ihere merem, ewe tiyekwam n’ọnọdu-ihere, n’ihi na eburum ita-uta nke mb͕e m’di na nwata.

20 Efraim, ọ̀ bu nwa-nwoke di oké ọnu-ahia M’nwere? ọ̀ bu nwa nātọm utọ nke-uku? n’ihi na ka mb͕e ra M’nēkwu okwu megide ya, anamecheta ya nke-ọma rue ub͕u a: n’ihi nka ngiri-afọm adaworo ya udà; aghaghm inwe obi-ebere n’aru ya ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

21 Me ka ogidi di iche iche iri uzọ ama guzoro onwe-gi ọtọ, doro onwe-gi ide di iche iche iri uzọ ama: tukwasi obi-gi n’uzọ ahu atuliri atuli, bú uzọ nke i jere ije nime ya: lata, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú israel, lata n’obodo-gi ndia.

22 Rùe ole mb͕e ka i ganēje iru na azu, gi ada nke nādaghachi azu? n’ihi na Jehova ekèwo ihe -ohu n’uwa, Nwanyi gānọ nwoke buruburu.

23 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ha gēkwu kwa okwu a ọzọ n’ala Juda, na n’obodo-ya nile, mb͕e m’gēme ka ndi-ya adọtara n.agha lata, si: Jehova gọzie gi, gi ebe-obibi nke ezi omume, gi ugwu nke idi-nsọ.

24 Juda na obodo-ya nile gēbikọ nime ya n’otù; ndi-ubi, na ndi nāchiri ìgwè aturu-ha bulie ije.

25 N’ihi na emewom ka afọ jubiga nkpuru-obi nāda #mbà ókè, ọ bu kwa nkpuru-obi ọ bula nke nēru újú ka M’juworo.

26 Mb͕e nka gasiri m’we teta, we hu; uram we tọm utọ.

27 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), mb͕e M’gagha nkpuru madu na nkpuru anumanu n’ulo Israel na n’ulo Juda.

28 Ọ gēru kwa na, dika M’muworo anya n’aru ha iropu na ikwada, na itikpọ na ime ka ala n’iyì, na imejọ; otú a ka M’gāmu anya n’aru ha iwu ulo na iku ihe n’ubi; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

29 N’ubọchi ahu ha agaghi-asi kwa ọzọ, Nna-ayi-hà eriwo nkpuru-vine nāchaghi acha, ezé umu-ha we nēru izìzì.

30 Kama onye ọ bula gānwu n’ihi ajọ omume nke aka ya: madu ọ bula nke nēri nkpuru-vine nāchaghi acha, ezé-ya ganēru izìzì.

31 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), mb͕e Mu na ulo Israel na ulo Juda gāb͕a ọb͕ub͕a-ndu ọhu:

32 ọ bughi dika ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke Mu na ndi bu nna-ha b͕ara n’ubọchi M’jidere ha n’aka ime ka ha si n’ala Ijipt puta; n’ihi na ha onwe-ha mebiri ọb͕ub͕a-ndum ahu, ọ bu ezie na Mu onwem bu di nwe ha; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

33 N’ihi na nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ulo Israel gāb͕a mb͕e ubọchi nile ahu gasiri, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); M’gētiye iwum n’ime-ha, ọ bu kwa n’obi-ha ka M’gēdekwasi ya dika n’akwukwọ; M’gābu-kwa-ra ha Chineke, ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi:

34 ha agaghi-eme kwa onwe-ha ka ha muta ọzọ, onye ọ bula o me ka onye-ab͕ata-obi-ya muta, onye ọ bula o me kwa ka nwa-nne-ya muta, si, Maranu Jehova: n’ihi na ha nile gāmara Mu onwem, site n’onye dikarisiri ntà nime ha we rue onye dikarisiri uku nime ha, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): n’ihi na M’gāb͕aghara ajọ omume-ha, M’gaghi-echeta kwa nmehie-ha ọzọ.

35 Otú a ka Jehova siri, bú Onye nēnye anyanwu ka ọ buru ìhè n’ehihie, na ukpuru nile nke ọnwa na nke kpakpando nile ka ha buru ìhè n’abali, Onye nēme ka oké osimiri dere du mb͕e nmali-miri-ya nile nēbib͕ọ; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya:

36 Ọ buru na ukpuru ndia apua n’irum, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), nkpuru Israel gākwusi kwa n’ibu mba n’irum ubọchi nile.

37 Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na agātù elu-igwe nke di n’elu, ọ buru kwa na egwuputa ntọ-ala nile nke uwa nke di n’okpuru, Mu onwem gāju kwa nkpuru nile nke Israel n’ihi ihe nile nke ha meworo; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

38 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), mb͕e agēwuru Jehova obodo a site n’ulo-elu nke Hananel rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku.

39 Eriri ọtùtù gāpu kwa ọzọ na ncherita-iru ya, rue ugwu ntà Gareb, ọ gāga kwa buruburu rue Goa.

40 Ndagwurugwu ahu nile nke ozu, na nke ntu, na ọzara nile rue miri-iyi Kidron, rue nkuku ọnu-uzọ-ama inyinya n’akuku ọwuwa-anyanwu, gābu ihe nsọ Jehova nwere; agaghi-eropu ya, agaghi-etikpọ kwa ya ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 32

1 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova n’arọ nke-iri nke Zedekaia, bú eze Juda, nke bu arọ nke-iri-na-asatọ nke Nbukadreza.

2 Ma mb͕e ahu usu-ndi-agha eze Babilon nānọchigide Jerusalem n’agha: ma Jeremaia, bú onye-amuma, nọ ka onye eb͕ochibidoworo n’ogige ulo-nche, nke di n’ulo eze Juda.

3 N’ihi na Zedekaia, bú eze Juda, b͕ochibidoro ya-ri, si, Gini mere gi onwe-gi ji ebu amuma, si, Otú a ka Jehova siri, Le, M’gaje inye obodo a n’aka eze Babilon, ọ gēwere kwa ya;

4 ma Zedekaia, bú eze Juda, agaghi-ewepuga onwe-ya n’aka ndi Kaldea, kama aghaghi inye ya n’aka eze Babilon, ha gēkwurita kwa ọnu na ọnu, anya-ya gāhu kwa anya-ya:

5 ọ bu kwa Babilon ka ọ gēme ka Zedekaia jerue, ọ bu kwa n’ebe ahu ka ọ gānọ rue mb͕e M’gēleta ya, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): mb͕e unu gēbuso ndi Kaldea agha, ọ gaghi-agara unu nke-ọma?

6 Jeremaia we si, Okwu Jehova rurum nti, si,

7 Le, Hanamel nwa Shalum, bú nwa-nne nna-gi, gābiakute gi, si, Zutara onwe-gi ubim nke di n’Anatot: n’ihi na gi ka nb͕aputa ruru izuru ya.

8 Hanamel nwa nwa-nne nnam we biakutem, dika okwu Jehova si di, rue ogige ulo-nche, sim, Biko, zuru ubim nke di n’Anatot, nke di n’ala Benjamin: n’ihi na gi ka nnweta-ya ruru, ọ bu kwa gi nwe nb͕aputa-ya; zutara onwe-gi. M’we mara na okwu Jehova ka nka bu.

9 M’we zuru ubi ahu n’aka Hanamel nwa nwa-nne nnam, bú nke di n’Anatot, m’we tùara ya ego-ya, bú shekel iri na asa nke ọla-ọcha.

10 M’we de aham n’akwukwọ ala ahu, ka ya akàrà, kpọ ndi-àmà, tùara ya ego ahu n’ihe-ọtùtù.

11 M’we were akwukwọ nzuta-ala ahu, ma nke akara akàrà, nke ihe-ya enyere n’iwu na ukpuru-ya nile di nime ya, ma nke ghere oghe:

12 m’we were akwukwọ nzuta-ala ahu nye Beruk nwa Neraia, nwa Mahseia, n’anya Hanamel nwa nwa-nne nnam, na n’anya ndi-àmà ndi deworo aha-ha n’akwukwọ nzuta-ala ahu, n’anya ndi-Ju nile ndi nānọdu ala n’ogige ulo-nche ahu.

13 M’we nye Beruk iwu n’anya ha, si,

14 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Chiri akwukwọ ndia, bú akwukwọ nzuta-ala nka, ma nke akara akàrà, ma akwukwọ a nke ghere oghe, tiye ha n’ite urọ; ka ha we digide ọtutu ubọchi.

15 N’ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Agāzu kwa ulo na ubi na ubi-vine ọzọ n’ala nka.

16 M’we kpere Jehova ekpere, mb͕e m’nyesiri Beruk nwa Neraia akwukwọ nzuta-ala, ahu, si,

17 Ewo, Onye-nwe-ayi Jehova! le, Gi onwe-gi emewo elu-igwe na uwa site n’ike uku Gi na site n’ogwe-aka-Gi eseteri eseti: ọ dighi ihe ọ bula kariri Gi ime:

18 Gi onye nēmere nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri ọtutu ub͕ò ebere, Onye nākwughachi ajọ omume nke ndi bu nna n’obi umu-ha gēsota ha n’azu: Chineke uku, nke bu dike, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya:

19 I di uku na ndum-ọdu, di kwa ike n’omume: Onye anya-Gi ghere oghe ilekwasi uzọ nile nke umu madu; inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, na dika nkpuru omume-ya nile si di:

20 Onye doro ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-ebube di iche iche n’ala Ijipt, rue ta, ma n’etiti Israel ma n’etiti madu ọzọ; I we mere Onwe-gi aha, dika ta;

21 I we ji ihe-iriba-ama di iche iche, ji kwa ihe-ebude di iche iche, ji kwa aka di ike, ji kwa ogwe-aka setiri eseti, ji kwa egwu di uku, me ka ndi-Gi, bú Israel, si n’ala Ijipt puta;

22 I we nye ha ala nka, nke I ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya;

23 ha we bata, nweta ya; ma ha egeghi nti olu-Gi, ọ bu kwa n’iwu-Gi ka ha nējegharighi; n’ihe nile nke I nyere ha n’iwu ime ọ dighi nke ha meworo: I we me ka ihe ọjọ a nile dakwasi ha:

24 Le, obo-ihe ndia atuliri atuli, ha abiaruwo obodo a iwere ya; enyewo kwa obodo a n’aka ndi Kaldea ndi nēbuso ya agha, n’ihi mma-agha, na oké unwu, na ajọ ọria nēfe efe: ihe I kwuworo erèwo kwa; ma, le, I nāhu ya.

25 Ma Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi Jehova, asiwom, Were ego zutara onwe-gi ubi ahu, kpọ kwa ndi-àmà; ma enyewo obodo a n’aka ndi Kaldea.

26 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si,

27 Le, Mu onwem bu Jehova, Chineke nke anu-aru nile, bú madu: ọ̀ di ihe ọ bula karirim ime?

28 N’ihi nka ka Jehova ji si otú a: Le, M’gaje inye obodo a n’aka ndi Kaldea, na n’aka Nebukadreza, bú eze Babilon, ọ gēwere kwa ya:

29 ndi Kaldea, bú ndi nēbuso obodo a agha, gābia kwa suye obodo a ọku, sure ya na ulo nile, nke ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nye Beal n’elu-ha, wusi-kwa-ra chi ọzọ di iche iche àjà-ihe-ọṅuṅu, ka ha we kpasuem iwe.

30 N’ihi na umu Israel na umu Juda aghọwo nání ndi nēme ihe jọrọ njọ n’anyam abua site na mb͕e ha di na nwata: n’ihi na umu Israel bu nání ndi ji ọlu aka-ha akpasum iwe; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

31 N’ihi na ihe ikpasu iwem na ikpasu ọnumam ka obodo a buruworom site n’ubọchi mb͕e ha wuru ya we rue ta; ka M’we si n’irum wezuga ya:

32 n’ihi ihe ọjọ ahu nile nke umu Israel na nke umu Juda, nke ha meworo ikpasum iwe, ha onwe-ha, na ndi-eze-ha, na ndi-isi-ha, na ndi-nchu-àjà-ha, na ndi-amuma-ha, na ndi Juda, na ndi bi na Jerusalem.

33 Ha we b͕akutam azu, ha echeghm iru: anameme kwa ka ha muta ihe, nēbili n’isi-ututu nēme ka ha muta, ma ha adighi-anu inara idọ́-aka-na-nti.

34 Ha we do ihe-árú nile ha n’ulo ahu nke akpọkwasiri aham, imeru ya.

35 Ha we wue ebe nile di elu nke Beal, nke di na ndagwurugwu nwa Hinom, ime ka umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom si n’ọku gabigarue Molek; bú ihe nke M’nēnyeghi ha n’iwu, ọ bataghi kwa n’obim, ka ha we me ihe-árú a; ime ka Juda mehie.

36 Ma ub͕u a n’ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke Israel, ji kwue okwu di otú a bayere obodo a, nke unu onwe-unu nāsi, Enyewo ya n’aka eze Babilon site na mma-agha, na site n’oké unwu, na site n’ajọ ọria nēfe efe:

37 si, Le, M’gaje ichikọputa ha n’ala nile, ebe M’chugaworo ha n’iwem, na n’ọnumam, na n’oké iwe di uku; M’gēme kwa ka ha lata n’ebe a, me kwa ka ha biri na ntukwasi-obi:

38 ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke:

39 M’gēnye kwa ha otù obi na otù uzọ, itu egwu Mu onwem ubọchi nile; ka o we diri ha, di-kwa-ra umu-ha ndi gānọchi ha, nma:

40 Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M’gaghi-esi n’iso ha ime ha nma laghachi azu; ma egwum ka M’gētiye n’obi-ha, ka ha we ghara isi n’ebe M’nọ wezuga onwe-ha.

41 Obi gātọkwam utọ n’aru ha ime ha nma, M’gēji kwa obim nile, ji kwa nkpuru-obim nile, kua ha n’ala nka n’ezie dika osisi.

42 N’ihi na otú a ka Jehova siri: Dika M’meworo ka ihe ọjọ uku a nile biakute ndi nka, otú a ka Mu onwem nēme ka ezi ihe ahu nile biakwasi ha, bú nke Mu onwem nēkwu bayere ha.

43 Agāzú kwa ọhia n’ala nka, nke unu onwe-unu nāsi, Nkpọnkpọ ebe ka ọ bu, nke ọ nādighi madu ma-ọbu anumanu bi nime ya; enyewo ya n’aka ndi Kaldea.

44 Ubi ka agāzú nēgo, de kwa aha n’akwukwọ-ha, ka kwa ha akàrà, kpọ kwa ndi-àmà, n’ala Benjamin, na n’ebe nile di Jerusalem buruburu, na n’obodo nile nke Juda, na n’obodo nile nke ugwu, na n’obodo nile nke ebe di ala ala, na n’obodo nile nke Negeb: n’ihi na M’gēme ka ndi-ha adọtara n’agha lata; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 33

1 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti nke ub͕ò abua, mb͕e ya onwe-ya nọ ka onye eb͕ochibidoworo n’ogige ulo-nche, si,

2 Otú a ka Jehova, bú Onye nēme ya, Jehova, bú Onye nākpu ya ime ka o guzosie ike, Onye Jehova bu aha-Ya, siri:

3 Kpọkuem, na M’gāza gi, gosi kwa gi ihe uku di iche iche, nke di kwa ike ighọta, nke i nāmaghi.

4 N’ihi na okwu di otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, kwuru bayere ulo nile nke obodo a, baye-kwa-ra ulo nile nke ndi-eze Juda, nke akwadaworo imegide obo-ihe nile atuliri atuli na imegide mma-agha, si:

5 Ha nābia ibuso ndi Kaldea agha, na imeju ha n’ozu madu ndi M’tib͕uworo n’iwem na n’ọnumam, ndi M’zonariwo-kwa-ra obodo a irum n’ihi ihe ọjọ nile ha.

6 Le, M’gaje ime ka anu-aru ọhu puchie n’aru ya, ya na ngwọta, M’gāgwọta kwa ha; M’gēkpughe-kwa-ra ha nbabiga-ókè nke udo na ezi-okwu.

7 M’gēme kwa ka ndi Juda adọtara n’agha na ndi Israel adọtara n’agha lata, M’gēwu kwa ha dika ulo, dika na mbu.

8 M’gēme kwa ka ha si n’ajọ omume nile ha, bú nke ha mehieworo megidem, di ọcha; M’gāb͕aghara kwa ha ajọ omume-ha nile nke ha mehieworo megidem, na nke ha jehieworo megidem n’ime ha.

9 Obodo a gāghọ-kwa-ram aha obi-utọ, na otuto, na ima-nma, diri mba nile nke uwa, ndi gānu ezi ihe ahu nile nke Mu onwem nēmere ha, ndi gātu kwa oké egwu ma jijiji n’ihi ezi ihe ahu nile na n’ihi udo ahu nile nke Mu onwem nēmere ya.

10 Otú a ka Jehova siri: Agānu kwa ọzọ n’ebe a, nke unu onwe-ūnu nāsi, Nkpọnkpọ ebe ka ọ bu, nke ọ nādighi madu ma-ọbu anumanu nēbi nime ya, ọbuná n’obodo nile nke Juda, na n’èzí nile nke Jerusalem, nke bu ebe tọb͕ọrọ n’efu, nke ọ n’adighi madu, ọ nādighi kwa onye-obibi, ọ nādighi kwa anumanu, nēbi nime ha,

11 agānu kwa ọzọ olu nke obi-utọ na olu ọṅù, na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu, na olu nke ndi nāsi, Kelenu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n’ihi na Jehova di nma, n’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na olu nke ndi nēwebata ekele n’ulo Jehova. N’ihi na M’gēme ka ndi ala nka adọtara n’agha lata dika na mbu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

12 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: N’ebe a, nke bu nkpọnkpọ ebe, nke ọ nādighi madu ma-ọbu anumanu nēbi nime ya, na n’obodo-ya nile, ka ebe-obibi nke ndi-ọzùzù-aturu ndi nēme ka ìgwè ewu na aturu-ha makpu gādi kwa ọzọ.

13 N’obodo nile nke ugwu, na n’obodo nile nke ebe di ala ala, na n’obodo nile nke Negeb, na n’ala Benjamin, na n’ebe nile nke di Jerusalem buruburu, na n’obodo nile nke Juda, ka ìgwè ewu na aturu gāgabiga kwa ọzọ n’okpuru aka abua nke onye nāgu ha ọnu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

14 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), mb͕e M’gēme ka ezi okwu ahu guzosie ike, bú nke M’gwaworo ulo Israel, nke M’kwuwo-kwa-ra bayere ulo Juda.

15 N’ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, ka M’gēme ka Ihe-opupú nke ezi omume puere Devid; ọ gēme kwa ihe ekpere n’ikpe na ezi omume n’ala nka.

16 N’ubọchi ahu ka agāzọputa Juda, Jerusalem gēbi kwa na ntukwasi-obi: nka bu kwa aha nke agākpọ ya, Jehova bu ezi omume-ayi.

17 N’ihi na otú a ka Jehova siri: Agaghi-ebipu n’ulo Devid onye nwe inọkwasi n’oche-eze ulo Israel;

18 ọzọ, agaghi-ebipu n’ulo ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, n’irum onye nwe isure àjà-nsure-ọku, na isure onyinye-inata-iru-ọma dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì, utọ, na ichu àjà ubọchi nile.

19 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si,

20 Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na unu gēmebi ọb͕ub͕a-ndum nke ehihie, na ọb͕ub͕a-ndum nke abali, ka ehihie na abali we ghara id i na mb͕e-ha;

21 ya bu na agēmebi ọb͕ub͕a-ndum, nke Mu na Devid, bú orùm, b͕ara, ka o we ghara inwe nwa-nwoke nke bu eze n’elu oche-eze-ya; na ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ndi Livai, bú ndi-nchu-àjà, ndi nējerem ozi, b͕ara.

22 Otú agaghi-agu usu ihe di n’elu-igwe ọnu, na otú agaghi-atùta ájá nke oké osimiri; otú a ka M’gēme ka nkpuru Devid, bú orùm, na ndi Livai ndi nējerem ozi, ba uba.

23 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si,

24 Ì hughi ihe ndi nka kwuworo, si, Ab͕uru abua nke Jehova rọputara, Ọ juworo ha? ọ bu kwa ndim ka ha nēlelì anya, ha we ghara ibu kwa mba n’iru ha ọzọ.

25 Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na ọb͕ub͕a-ndum nke ehihie na abali adighi, ọ buru na atọghm ukpuru nile nke elu-igwe na uwa;

26 ya bu na M’gāju nkpuru Jekob, na Devid, bú orùm, M’we ghara isi na nkpuru-ya were ndi ganāchi nkpuru nke Abraham na Aisak na Jekob: n’ihi na M’gēme ka ndi-ha adọtara n’agha lata, M’gēnwe kwa obi-ebere n’aru ha.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 34

1 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Nebukadneza, bú eze Babilon, na usu-ndi-agha-ya nile, na ala-eze nile nke uwa nke aka-ya nāchi, na ndi nile di iche iche, nēbuso Jerusalem, nēbuso kwa obodo-ya nile, agha, si:

2 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Je, gwa Zedekaia, bú eze Juda, okwu, si ya, Otú a ka Jehova siri, Le, M’gaje inye obodo a n’aka eze Babilon, ọ gēsure kwa ya n’ọku:

3 ma gi onwe-gi aghaghi-iwepuga onwe-gi n’aka-ya, kama aghaghi iwere gi, ọ bu kwa n’aka-ya ka agēnye gi; anya-gi abua gāhu kwa anya abua nke eze Babilon, unu gēkwurita kwa ọnu na ọnu, ọ bu kwa Babilon ka i gābà.

4 Ma otú ọ di, nuru okwu Jehova, gi Zedekaia, bú eze Juda: okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere gi, si, I gaghi-anwu site na mma-agha:

5 n’udo ka i gānwu; ọzọ, nsure nile nke nna-gi-hà, bú ndi-eze mbu, ndi buru gi uzọ, otú a ka ha gēsurere gi ihe; ọzọ, Éwù, onye-nwe-ayi! ka ha gāsi n’itiri gi aka n’obi; n’ihi na okwu ka Mu onwem kwuworo; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

6 Jeremaia, bú onye-amuma, we gwa Zedekaia, bú eze Juda, okwu ndia nile nime Jerusalem,

7 mb͕e usu-ndi-agha nke eze Babilon nēbuso Jerusalem, nēbuso kwa obodo Juda nile fọduru, agha, bú Lekish na Azeka; n’ihi na nání ndia fọduru nime obodo nile nke Juda, bú obodo ewusiri ike.

8 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Zedekaia, bú eze, na ndi Israel nile ndi nọ Jerusalem, b͕asiri ndu, ikpọsara ha si na ha nwere onwe-ha;

9 na ha nile gēzilaga, onye ọ bula orù-ya nwoke, na onye ọ bula nwanyi nējere ya ozi, nke bu nwoke Hibru ma-ọbu nwanyi Hibru, inwere onwe-ya; ka madu we ghara ime ka ha fè ya òfùfè-orù, onye ọ bula o me ka onye-Ju, bú nwa-nne-ya, fè ya:

10 ndi-isi nile na ndi Israel nile we nuru, bú ndi bàra n’ọb͕ub͕a-ndu ahu, izilaga, onye ọ bula orù-ya nwoke, na onye ọ bula nwanyi nējere ya ozi, inwere onwe-ha, ka madu ọ bula we ghara ime kwa ka ha fè ya òfùfè-orù ọzọ; ha we nuru, zilaga ha:

11 ma emesia ha chighariri, me ka ndi-orù-ha ndikom na ndinyom ndi nējere ha ozi, bú ndi ha zilagarari inwere onwe-ha, lata, ha we buda ha ka ha buru orù-ndikom na ndinyom nējere ha ozi:

12 okwu Jehova we rue Jeremaia nti site na Jehova, si,

13 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri: Mu onwem na nna-unu-ha b͕ara ndu n’ubọchi M’mere ka ha si n’ala Ijipt, n’ulo ndi-orù, puta, si,

14 N’ọgwugwu arọ asa unu gēzilaga, onye ọ bula nwa-nne-ya, bú onye-Hibru, nke rere onwe-ya n’aka-gi, we fè gi arọ isi, i gēzilaga ya inwere onwe-ya: ma nna-unu-hà egeghm nti, ha atọghi kwa nti-ha n’ala.

15 Unu onwe-unu we chigharia ta, we me ihe ziri ezi n’anyam abua, n’ikpọsa, onye ọ bula ọ gwa madu-ibe-ya, si ka o nwere onwe-ya pua n’aka-gi; unu we b͕a ndu n’irum n’ulo nke akpọkwasiri aham:

16 unu we chigharia me ka aham ghara idi nsọ, me, onye ọ bula o me orù-ya nwoke, onye ọ bula o me nwanyi nke nējere ya ozi, ka ha lata, bú ndi unu zilagarari inwere onwe-ha n’ọchichọ nkpuru-obi-ha; unu we buda ha iburu unu orù-ndikom na ndinyom nējere unu ozi.

17 N’ihi nka ka Jehova ji si otú a: Unu onwe-unu egeghm nti, ikpọsa, onye o bula ọ gwa nwa-nne-ya, onye ọ bula o gwa madu-ibe-ya, si ka o nwere onwe-ya: le, M’nākpọsara unu si na unu nwere onwe-unu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ibà na mma-agha, na ibà n’ajọ ọria nēfe efe, na ibà n’oké unwu; M’gēwere kwa unu nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari.

18 M’gēwere kwa ndikom ndi nējehie n’ọb͕ub͕a-ndum nye, bú ndi nēmeghi ka okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke ha b͕ara n’irum guzosie ike, bú nwa-ehi nke ha kpọwara abua, we gabiga n’etiti nkpọwa-ya abua;

19 bú ndi-isi Juda, na ndi-isi Jerusalem, na ndi-onozi, na ndi-nchu-àjà, na ndi nile nke ala nka, ndi gabigaworo n’etiti nkpọwa abua nke nwa-ehi ahu;

20 M’gēwere ha nye n’aka ndi-iro-ha, na n’aka ndi nāchọ ndu-ha: ozu-ha ewe ghọrọ anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anu-ọhia nke uwa, ihe-oriri.

21 Ọ bu kwa Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-isi-ya ka M’gēnye n’aka ndi-iro-ha, na n’aka ndi nāchọ ndu-ha, na n’aka usu-ndi-agha nke eze Babilon, ndi nēsi n’ebe unu nọ rigo la.

22 Le, M’gaje inye iwu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), me ka ha biaghachi n’obodo a; ha gēbuso kwa ya agha, were ya, sure ya n’ọku: ọ bu kwa obodo nile nke Juda ka M’gēme ka ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu, ghara inwe onye-obibi.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 35

1 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site Jehova n’ubọchi Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, si,

2 Je n’ulo ndi Rikab, gwa ha okwu, me ka ha bata n’ulo Jehova, n’otù n’ime-ulo-ya, me ka ha ṅua manya-vine.

3 M’we kuru Jeazanaia nwa Jeremaia, nwa Habazinaia, na umu-nne-ya, na umu-ya ndikom nile, na ulo nile nke ndi Rikab;

4 m’we me ka ha bata n’ulo Jehova, n’ime-ulo umu Henan nwa Igdalaia, bú onye nke Chineke, nke di n’akuku ime-ulo ndi-isi, nke di n’elu ime-ulo Maaseia nwa Shalum, bú onye-nche nke nbata-uzọ:

5 M’we che n’iru umu ulo ndi Rikab ọkwa ufọdu juputara na manya-vine na iko ufọdu, m’we si ha, Ṅuanu manya-vine.

6 Ha we si, Ayi agaghi-aṅu manya-vine: n’ihi na Jonadab nwa Rikab, bú nna-ayi, nyere ayi iwu, si, Unu aṅula manya-vine, unu onwe-unu, na umu-unu, rue mb͕e ebighi-ebi:

7 unu ewu-kwa-la ulo, unu agha-kwa-la nkpuru, unu aku-kwa-la ubi-vine, unu enwe-kwa-la ihe ndia: kama ọ bu n’ulo-ikwū ka unu gēbi ubọchi nile nke unu; ka unu we di ndu ọtutu ubọchi n’elu ala ahu ebe unu onwe-unu bu ndi-ọbìa.

8 Ayi we ge nti olu Jonadab nwa Rikab, bú nna-ayi, n’ihe nile nke o nyere ayi n’iwu, ighara iṅu manya-vine ubọchi nile ayi, ayi onwe-ayi, na ndinyom-ayi, na umu-ayi ndikom, na umu-ayi ndinyom;

9 na ighara iwu ulo ka ayi we biri nime ha: ọ dighi kwa ubi-vine, ma-ọbu ubi, ma-ọbu nkpuru-ọghigha ayi nwere:

10 ayi we biri n’ulo-ikwū, we ge nti, me dika ihe nile si di nke Jonadab, bú nna-ayi, nyere ayi n’iwu.

11 O rue, mb͕e Nebukadreza, bú eze Babilon, rigotara n’ala nka, na ayi siri, Bianu, ka ayi ba na Jerusalem n’ihi usu-ndi-agha nke ndi Kaldea, na n’ihi usu-ndi-agha nke Siria; ayi we biri na Jerusalem.

12 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si,

13 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Je, si ndi Juda, si kwa ndi bi na Jerusalem, Ùnu agaghi-anara idọ-aka-na-nti ige nti okwum nile? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

14 Emewo ka okwu nile nke Jonadab nwa Rikab guzosie ike, bú nke o nyere umu-ya n’iwu, ka ha ghara iṅu manya-vine, ha aṅughi kwa manya-vine rue ta, n’ihi na ha anuwo ihe nke nna-ha nyere n’iwu: ma Mu onwem agwawo unu okwu, nēbili n’isi-ututu nēkwu; ma unu egeghm nti.

15 M’we zitere unu ndi-orùm nile, bú ndi-amuma, nēbili n’isi-ututu nēzite ha, si, Biko, sinu, onye ọ bula n’uzọ ọjọ ya, lata, me-kwa-nu ka omume nile unu di nma, unu ejeso-kwa-la chi ọzọ ifè ha, biri-kwa-nu n’ala nka nke M’nyere unu, nye kwa nna-unu-hà: ma unu atọghi nti-unu n’ala, unu egeghkwam nti.

16 N’ihi na umu Jonadab nwa Rikab emewo ka ihe ahu nna-ha nyere n’iwu guzosie ike, bú nke o nyere ha n’iwu, ma ndi nka egeghm nti;

17 n’ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Le, M’gaje ime ka ihe ọjọ ahu nile biakute Juda, biakute kwa ndi nile bi na Jerusalem, bú nke M’kwuworo megide ha: n’ihi na agwawom ha okwu, ma ha anughi; M’we kpọ ha òkù, ma ha azaghi.

18 Jeremaia we si ulo ndi Rikab, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: N’ihi na unu egewo nti ihe Jonadab, bú nna-unu, nyere n’iwu, unu we debe ihe nile o nyere n’iwu, unu we me dika ihe nile si di nke o nyere unu n’iwu;

19 n’ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Agaghi-ebipu n’ulo Jonadab nwa Rikab onye nwe iguzo n’irum ubọchi nile.