Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 16

1 Okwu Jehova we ruem nti, si

2 I gaghi-alutara onwe-gi nwunye, i gaghi-enwe kwa umu-ndikom na umu-ndinyom n’ebe a.

3 N’ihi na okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere umu-ndikom baye-kwa-ra umu-ndinyom, ndi amuru n’ebe a, baye-kwa-ra nne-ha ndi muru ha, baye-kwa-ra nna-ha ndi muru ha n’ala nka, si,

4 Site n’ọnwu nke ọria di iche iche ka ha gānwu; agaghi-etiri ha aka n’obi, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu n’elu ala ka ha gāghọ: ha gēsite kwa na mma-agha, site kwa n’oké unwu, gwusia; ozu-ha gāghọ-kwa-ra anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri.

5 N’ihi na otú a ka Jehova siri, Abala n’ulo nke ikwa-ozu, eje-kwa-la iti aka n’obi, egosi-kwa-la ha ebere i nwere n’aru ha: n’ihi na ewepuwom udom n’ebe ndi nka nọ, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), bú ebere na obi-ebere nile.

6 Ha gānwu kwa, ma ndi uku ma ndi ntà, n’ala nka: agaghi-elì ha, madu agaghi-eti-kwa-ra ha aka n’obi, madu agaghi-ebì kwa onwe-ya mma, ọ gaghi-eme-kwa-ra ha isi-nkwọcha:

7 agaghi-ekesara ha nri n’iru-újú, ikasi madu obi bayere onye nwuru anwu; agaghi-eme kwa ka ha ṅua iko nkasi-obi bayere nna madu ma-ọbu bayere nne madu.

8 Ọzọ, n’ulo nke oké oriri ka i nāgaghi-abà inọyere ha iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu.

9 N’ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M’gaje ime ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nwoke nālu nwunye ọhu na olu nwanyi anālu ọhu kwusi n’ebe a n’anya-unu na n’ubọchi-unu.

10 O gēru kwa, mb͕e i gēgosi ndi nka okwu ndia nile, ha ewe si gi, N’ìhi gini ka Jehova kwuworo ihe ọjọ uku a nile megide ayi? ma-ọbu gini bu ajọ omume-ayi? ma-ọbu gini bu nmehie-ayi nke ayi mehieworo megide Jehova, bú Chineke-ayi?

11 I gāsi kwa ha, N’ihi na nna-unu-hà arapuwo Mu onwem, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ha we jeso chi ọzọ di iche iche, fè ha, kpọ isi ala nye ha, ma Mu ka ha rapuru, ọ bu kwa iwum ka ha nēdebeghi;

12 unu onwe-unu emewo kwa ihe ọjọ kari nna-unu-hà; n’ihi na, le, unu nējeso, onye ọ bula isi-ike nke obi ọjọ ya unu we ghara igem nti:

13 M’gātupu kwa unu n’elu ala nka tukwasi unu n’ala ahu nke unu nāmaghi, ma ọ bu unu onwe-unu ma -ọbu nna-unu-hà; unu gēfè kwa chi ọzọ di iche iche n’ebe ahu ehihie na abali; n’ihi na M’gaghi-emere unu amara.

14 N’ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na agaghi-asi kwa ọzọ, Jehova nādi ndu, bú Onye mere ka umu Israel si n’ala Ijipt rigoputa;

15 kama agāsi, Jehova nādi ndu, bú Onye mere ka umu Israel si n’ala Ugwu na n’ala nile ebe Ọ chusara ha-ri rigoputa: M’gēme kwa ka ha lata n’ala ahu nke M’nyere ndi bu nna-ha.

16 Le, M’gaje iziga kpọ ọtutu ndi-ọ́kù, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ha gākùru ha; emesia M’gēziga kpọ ọtutu ndi-ntá, gēsi n’elu ugwu ọ bula, na n’elu ugwu ntà ọ bula, na nime nb͕awa nkume nile di elu, chu ntá ha.

17 N’ihi na anyam abua dikwasi n’uzọ nile ha: ezopughi ha n’irum, ezobeghi kwa ajọ omume-ha pua n’iru anyam abua.

18 Ma M’gēburu uzọ kwughachi ajọ omume-ha na nmehie-ha okpukpu abua; n’ihi na ha emewo alam ka ọ ghara idi nsọ n’ozu nke nile ha nke nāsọ oyi, ọ bu kwa ihe-árú nile ha ka ha ji kpojue ihe-nketam.

19 Jehova, ikem, na ebem siri ike, na ebe-nb͕abàm n’ubọchi nkapab͕u, Gi ka mba nile gābiakute site na nsọtu nile nke uwa, si, Nání okwu-agha ka nna-ayi-hà ketaworo, bú ihe-efu na ihe nke ọ nadighi urù ha bara.

20 Madu, ọ̀ gēmere onwe-ya chi di iche iche, ọ bu ezie na ihe ahu abughi chi?

21 N’ihi nka, le, M’gaje ime ka ha mara, na mb͕e a ka M’gēme ka ha mara akam na idi-ikem; ha gāmara kwa na aham bu Jehova.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 17

1 Ejiwo pen ígwè, ji kwa ọnu-ọnu diamond, de nmehie Juda: atuwo ya n’elu mbadamba nkume, bú obi-ha, na n’elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nile nke umu;

2 ebe umu-ha nēcheta ebe-ichu-aja nile ha na Asherim-ha n’akuku osisi ndu n’elu ugwu ntà ha nile di elu.

3 Gi ugwum nke di n’ọhia, ume-gi na àkù-gi nile ka M’gēnye ka ọ buru ihe-nluta-n’agha, M’gēnye kwa ebe-gi nile di elu, n’ihi nmehie, n’ókè-ala-gi nile.

4 I gārapu kwa, ọbuná site n’onwe-gi, ihe-nketa-gi nke M’nyere gi; M’gēme kwa ka i fè ndi-iro-gi n’ala ahu nke i nāmagh: n’ihi na ọku ka unu muyeworo n’iwem, rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ gēre.

5 Otú a ka Jehova siri: Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nātukwasi madu obi, we me ka anu-aru, bú madu, buru ogwe-aka-ya, onye obi-ya nēsi kwa n’ebe Jehova nọ wezuga onwe-ya.

6 Ọ gādi kwa ka osisi tamarisk n’ala ihe nādighi, ọ gaghi-ahu kwa mb͕e ọdi-nma nābia; ma ọ gēbi n’ebe nile kpọrọ nku n’ọzara, bú ala nnú ebe madu nēbighi.

7 Onye agọziri agọzi ka nwoke ahu bu nke nātukwasi Jehova obi, onye Jehova bu ihe-ntukwasi-obi-ya.

8 Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n’akuku miri, ọ bu kwa n’akuku osimiri ka ọ nāwasa nkpọrọgwu-ya, ọ dighi-atu kwa egwu mb͕e okpom-ọku nābia, ma akwukwọ-ya gābu akwukwọ ndu; ọzọ, n’arọ nb͕ochi miri-ozuzo ọ gaghi-echeb͕u onwe-ya, ọ gaghi-apu kwa n’imì nkpuru.

9 Obi di aghughọ kari ihe nile, ihe nādighi ngwọta ka ọ bu kwa: ònye gāmara ya?

10 Mu onwem, bú Jehova, nēnyocha obi, nānwa akuru, ọbuná inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, dika nkpuru nke omume-ya nile si di.

11 Dika ọkwa nke nēkpokọba umu nke ọ nāmughi, otú a ka onye nākpa àkù, ma ọ kpaghi ya n’ikpé ziri ezi, si di; n’etiti ubọchi ndu-ya ọ gārapu ya, n’ikpe-azu-ya o we buru onye-nzuzu.

12 Oche-eze nke di ebube, nke di n’elu site na mbu, ọnọdu nke ebe nsọ ayi,

13 olile-anya Israel, ka Jehova bu, ihere gēme ndi nile nārapu Gi: ndi nēsi n’ebe M’nọ wezuga onwe-ha, n’ala ka agēde ha, n’ihi na ha arapuwo isi-iyi nke miri nēnye ndu, bú Jehova.

14 Me ka m’diri ndu, Jehova, m’we diri ndu; zọputam, ewe zọputam: n’ihi otutom ka I bu.

15 Le, ndi ahu nāsim, Òle ebe okwu Jehova di? biko, ya bia.

16 Ma mu onwem, anukpọghm ipu n’iso Gi n’izù aturu; ọzọ, ubọchi nādighi ngwọta, achọsighm ya ike; Gi onwe-gi mara: ihe si n’eb͕ub͕ere-ọnum puta, na ncherita-iru Gi ka ọ diworo.

17 Aghọlam ihe-ujọ: ebe-nb͕abàm ka I bu n’ubọchi ihe ọjọ.

18 Ka ihere me ndi nēsob͕um, ma ka ihere ghara ime mu onwem; ka ndi ahu tua ujọ, ma ka mu onwem ghara itu ujọ: me ka ubọchi ihe ọjọ biakwasi ha, were kwa okpukpu ntipia abua tipia ha.

19 Otú a ka Jehova sirim: Je, guzo n’ọnu-uzọ-ama nke umu ndim, nke ndi-eze Juda nēsi abata, nke ha nēsi apu kwa, guzo kwa n’ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem;

20 si ha, Nurunu okwu Jehova, unu ndi-eze Juda, na Juda nile na ndi nile bi na Jerusalem, bú ndi nābata n’ọnu-uzọ-ama ndia:

21 otú a ka Jehova siri: Lezienu onwe-unu anya, unu ebu-kwa-la ibu n’ubọchi-izu-ike, unu ebubà-kwa-la ya n’ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem;

22 unu agaghi-ebupu kwa ibu n’ulo-unu n’ubọchi-izu-ike, ọ bu kwa ozi ọ bula ka unu nāgaghi-eje: ma donu ubọchi-izu-ike nsọ, dika M’nyere nna-unu-hà iwu;

23 ma ha anughi, ha atọghi kwa nti-ha n’ala, ha we kwesie olu-ha ike, ka ha we ghara inu, ghara kwa inara idọ-aka-na-nti.

24 O gēru kwa, ọ buru na unu egem nti nke-ọma, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ighara ibubata ibu n’ọnu-uzọ-ama nile nke obodo a n’ubọchi-izu-ike, kama ya ido ubọchi-izu-ike nsọ, ighara ije ozi ọ bula nime ya;

25 ndi-eze na ndi-isi, ndi nānọkwasi n’oche-eze Devid, gābata kwa n’ọnu-uzọ-ama nile nke obodo a, bú ndi nānọkwasi n’ub͕ọ-ala na n’inyinya, ha onwe-ha, na ndi-isi-ha, ndi Juda, na ndi bi na Jerusalem: obodo a gānọgide kwa rue mb͕e ebighi-ebi.

26 Ha gēsi kwa n’obodo nile nke Juda, si kwa n’ebe nile di Jerusalem buruburu, si kwa n’ala Benjamin, si kwa n’ebe di ala ala, si kwa n’ugwu, si kwa na Negeb, bia, nēwebata ihe àjà-nsure-ọku, na àjà ọzọ, na onyinye-inata-iru-ọma, na frankincense, nēwebata kwa ekele, n’ulo Jehova.

27 Ma ọ buru na unu egeghm nti ido ubọchi-izu-ike nsọ, na ighara ibū ibu bata n’ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem n’ubọchi-izu-ike; M’gēsuye kwa ọku n’ọnu-uzọ-ama-ya nile, ọ gērichapu kwa ulo-elu nile nke Jerusalem, agaghi-emenyu kwa ya.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 18

1 Okwu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, si,

2 Bilie, rida n’ulo ọkpu-ite, ọ bu kwa n’ebe ahu ka M’gēme ka i nu okwum.

3 M’we rida n’ulo ọkpu-ite, ma, le, ọ nēje ozi-ya n’elu wheel-ya abua.

4 Ewe bibie ihe onye ahu ji urọ akpu n’aka ọkpu-ite ahu, o we kpu kwa ya ọzọ ihe di iche, dika o ziri ezi n’anya ọkpu-ite ahu ikpu ya.

5 Okwu Jehova we ruem nti, si,

6 Àpughm ime unu dika ọkpu-ite a mere, unu ulo Israel? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta. Le, dika urọ si di n’aka ọkpu-ite a, otú a ka unu onwe-unu di n’akam, unu ulo Israel.

7 N’otù ntabi-anya ahu mb͕e M’nēkwu okwu bayere mba ọ bula, iropu ya na ikwada ya na ime ka ọ la n’iyì;

8 ọ buru na mba ahu nke M’kwuworo okwu bayere ya esi n’ihe ọjọ ya chigharia, M’gēchèghari kwa n’ihe ọjọ ahu nke M’chère ime ya.

9 Ọzọ, n’otù ntabi-anya ahu mb͕e M’nēkwu okwu bayere mba ọ bula, baye-kwa-ra ala-eze ọ bula, iwu ya dika ulo na iku ya dika osisi;

10 ọ buru na o me ihe jọrọ njọ n’anyam, we ghara ige nti n’olum, M’gēchèghari kwa n’ezi ihe ahu, nke M’siri na M’gēji me ya nma.

11 Ma ub͕u a, biko, gwa ndi Juda, gwa kwa ndi bi na Jerusalem, okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Le, Mu onwem nākpu ihe ọjọ megide unu, nēchè kwa èchìchè megide unu: biko, sinu, onye ọ bula n’uzọ ọjọ ya, lata, me kwa ka uzọ nile unu na omume nile unu di nma.

12 Ma ha siri, Ntukwasi-obi adigh: n’ihi na èchìchè nile nke ayi ka ayi nējeso, ayi nēme kwa, onye ọ bula ihe isi-ike nke obi ọjọ ya.

13 N’ihi nka ka Jehova ji si otú a: Biko, juanu n’etiti mba nile, si, Ònye nuworo ihe di ka ndia? ihe jọb͕uru onwe-ya nke-uku ka nwa-ab͕ọghọ Israel nke nāmaghi nwoke meworo.

14 Snow nke Lebanon, ọ̀ gārapu oké nkume nke ọhia? ma-ọbu miri oyi nke si n’ala ọzọ erù, ọ̀ gātada?

15 N’ihi na ndim echezọwom, ihe-efu ka ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nye; ha we me ka ha su ngọngọ n’uzọ nile ha, bú uzọ-ije nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, ije ije n’okporo-uzọ di iche iche, bú uzọ anātulighi atuli;

16 ime ka ala-ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ mb͕e ebighi-ebi; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n’akuku ya anya, o gēfufe kwa isi-ya.

17 Dika ifufe Iru-anyanwu ka M’gāchusa ha n’iru onye-iro; azu, ọ bughi iru, ka M’gēme ka hu ha n’ubọchi nhuju-anya-ha.

18 Ha we si, Bianu, ka ayi chè èchìchè megide Jeremaia; n’ihi na iwu agaghi-esi n’ebe onye-nchu-àjà nọ la n’iyì, ndum-ọdu agaghi-esi kwa n’ebe onye mara ihe nọ, okwu agaghi-esi kwa n’ebe onye-amuma nọ. Bianu, ka ayi were ire-ayi tib͕ue ya, ma ka ayi ghara iṅa nti n’okwu-ya nile.

19 Ṅam nti, Jehova, ge kwa nti olu ndi nālusom ọ̀gù.

20 Àgākwughachi ihe ọjọ n’ọnọdu ezi ihe? n’ihi na ha egwuworo nkpuru-obim olùlù. Cheta nguzo m’guzoro n’iru Gi ikwu ezi ihe bayere ha, ime ka ọnuma-Gi si n’aru ha laghachi.

21 N’ihi nka were umu-ha nye oké unwu, rara kwa ha nye n’aka mma-agha; ka ndinyom-ha ghọ kwa ndi b͕ara aka nwa na ndi di-ha nwuru; ka ndikom-ha ghọ kwa ndi ọnwu b͕uru, ka umu-okorọbia-ha ghọ ndi etib͕uru na mma-agha n’agha.

22 Ka anuru iti-nkpu nke gēsite n’ulo nile ha, mb͕e I gēme ka usu ndi nāpunara madu ihe biakwasi ha na mberebe: n’ihi na ha egwuwo olùlù inwudem, ha ezobewo-kwa-ra ukwum abua ib͕udu di iche iche.

23 Ma Gi onwe-gi, Jehova, amawo ndum-ọdu nile ha imegidem ime ka m’nwua; ekpuchila ajọ omume-ha, ehichapu-kwa-la nmehie-ha n’iru Gi: ma ka ha ghọ ndi emeworo ka ha su ngọngọ n’iru Gi; meso ha na mb͕e iwe-Gi.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 19

1 Otú a ka Jehova siri, Je, zuta karama nke ọkpu-ite ji urọ akpu, chiri kwa ufọdu nime ndi-okenye ndim, na nime ndi-okenye ndi-nchu-àjà;

2 purue ndagwurugwu nwa Hinom, nke di n’oghere ọnu-uzọ-ama ejùjù, kpọsa n’ebe ahu okwu nile nke M’gāgwa gi:

3 si, Nurunu okwu Jehova, unu ndi-eze Juda, na ndi bi na Jerusalem; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M’gaje ime ka ihe ọjọ biakwasi ebe a, nke nti abua nke onye ọ bula nānu ya gāzu wuruwuru.

4 N’ihi na ha arapuwom, we ghara imata ebe a, we surere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ nime ya, bú ndi ha nāmaghi, ha onwe-ha na ndi bu nna-ha na ndi-eze Juda; ha emejuwo kwa ebe a n’ọbara ndi nēmeghi ihe ọjọ;

5 ha ewuwo kwa ebe nile di elu nke Beal, isure umu-ha ndikom n’ọku ka ha buru àjà-nsure-ọku anāchuru Beal; nke M’nēnyeghi n’iwu, ekwughkwam ya, ọ bataghi kwa n’obim:

6 n’ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), mb͕e agaghi-akpọ kwa ebe a Tofet ọzọ, ma-ọbu Ndagwurugwu nwa Hinom, kama agākpọ ya Ndagwurugwu Ob͕ub͕u.

7 M’gāwusi kwa ndum-ọdu Juda na Jerusalem n’ebe a dika miri; M’gēme kwa ka ha da site na mma-agha n’iru ndi-iro-ha, na site n’aka ndi nāchọ ndu-ha: M’gēnye kwa ozu-ha iburu anu-ufe nke elu-igwe, na iburu anumanu nke uwa, ihe-oriri.

8 M’gēme kwa ka obodo a ghọ ihe-iju-anya, ka ọ ghọ kwa ihe-ima-ọsọ; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n’akuku ya anya, ọ gāma kwa ọsọ n’ihi ihe-otiti-ya nile.

9 M’gēme kwa ka ha rie anu-aru nke umu-ha ndikom na anu-aru umu-ha ndinyom, ha gēri kwa, onye ọ bula anu-aru ibe-ya, nime nnọchigide-n’agha na nime nkpab͕u, nke ndi-iro-ha na ndi nāchọ ndu-ha nākpab͕u ha.

10 I gētiwa kwa karama ahu n’anya ndikom ahu, bú ndi nēso gi je,

11 i gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọbuna otú a ka M’gētiwa ndi nka na obodo a, dika madu si etiwa ite ọkpu-ite, nke anāpughi imezi kwa ya ọzọ: ọ bu kwa na Tofet ka ha gēlì ozu, n’ihi na ebe ilì ozu adighi.

12 Otú a ka M’gēme ebe a, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), me kwa ndi bi ya, ọbuná ime obodo a ka ọ di ka Tofet:

13 ulo nile nke Jerusalem na ulo nile ndi-eze Juda, nke ruru árú, gādi kwa ka ebe Tofet, bú ulo nile nke ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì uto n’elu-ha nye usu nile nke ihe elu-igwe, wusi-kwa-ra chi ọzọ di iche iche àjà-ihe-ọṅuṅu.

14 Jeremaia we si na Tofet bia, ebe Jehova zigara ya ibu amuma; o we guzo n’ogige ulo Jehova, si ndi Israel nile:

15 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M’gaje ime ka ihe ọjọ a nile biakwasi obodo a, biakwasi kwa obodo-ya nile, bú nke M’kwuworo megide ya; n’ihi na ha ekwesiwo olu-ha ike, ka ha ghara inu okwum nile.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 20

1 Pashua nwa Imea, bú onye-nchu-àjà, nke bu kwa onye-nlekọta, onye-ndú n’ulo Jehova, Pashua ahu we nu ka Jeremaia nēbu amuma okwu ndia.

2 Pashua we tie Jeremaia, bú onye-amuma, ihe, tiye ya n’ọtọsi ahu nke di n’ọnu-uzọ-ama Benjamin di n’elu, nke di n’ulo Jehova.

3 O rue n’echi-ya, na Pashua mere ka Jeremaia si n’ọtọsi ahu puta. Jeremaia we si ya, Ọ dughi Pashua ka Jehova kpọworo aha-gi, kama ọ bu Megoa-misabibi.

4 N’ihi na otú a ka Jehova siri, Le, M’gaje ime gi ka i ghọrọ onwe-gi, ghọ-kwa-ra ndi nile nāhu gi n’anya, ihe-ujọ: ha gāda kwa site na mma-agha ndi-iro-ha, anya-gi abua ganāhu kwa ya: ọ bu kwa Juda nile ka M’gēnye n’aka eze Babilon, ọ gēme kwa ka ha je biri na Babilon, ọ gēji kwa mma-agha tib͕ue ha.

5 M’gēnye kwa ihe nile akpakọbara n’obodo a, na ihe nile putara na ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n’ọlu, na ihe-ya nile nke di oké ọnu-ahia, e, àkù nile nke ndi-eze Juda ka M’gēnye n’aka ndi-iro-ha, ndi gāluta ihe-ha n’agha, chiri ha, chibà ha na Babilon.

6 Gi onwe-gi kwa, Pashua, na ndi nile bi n’ulo-gi gēje na ndọta-n’agha: ọ bu kwa Babilon ka i gābata, ọ bu kwa n’ebe ahu ka i gānwu, ọ bu kwa n’ebe ahu ka agēlì gi, gi onwe-gi, na ndi nile nāhu gi n’anya, ndi i buworo amuma ugha.

7 I ràwom urà, Jehova, ewe ràram: I jidewom, we nwe ike karim: aghọwom ihe-ichì-ọchì ogologo ubọchi nile, madu nile ọ bula nākwam emò.

8 N’ihi na mb͕e ọ bula m’nēkwu, etim nkpu; Ihe-ike na Ipunara-madu-ihe, ka m’nākpọ nkpu: n’ihi na okwu Jehova ghọrọm ihe-ita-uta na ihe-ikwa-emò ogologo ubọchi nile.

9 M’we si, M’gaghi-ehota Ya, m’gaghi-ekwu kwa okwu ọzọ n’aha-Ya. O we di n’obim dika ọku nēre ere nke emechibidoro n’ọkpukpum nile, ike gwu-kwa-ram inagide ya, enweghkwam ike.

10 N’ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu, ujọ dim buruburu. Gosinu, ayi gēgosi kwa ya, ka ha nāsi, bú ndi nile mu na ha di n’udo, ndi nēche nche n’akukum; eleghi anya agāràra ya, ayi ewe nwe ike imegide ya, bọ̀ọ ọ́bọ̀-ayi n’aru ya.

11 Ma Jehova nọyerem dika dike nke nēme ka ama jijiji: n’ihi nka ndi nēsob͕um gāsu ngọngọ, ha agaghi-enwe kwa ike: ihere gēme ha nke-uku, n’ihi na ha enweghi uche, agaghi-echezọ ọnọdu-ihere di mb͕e ebighi-ebi nke etiyere ha.

12 Ma, Gi Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye nānwa onye ezi omume, Onye nāhu akuru na obi, ka m’hu ọ́bọ̀-Gi nke I gābọ̀ ha; n’ihi na Gi ka m’kpugheworo okwu-ikpém.

13 Bùkuenu Jehova abù, tonu Jehova: n’ihi na Ọ naputawo nkpuru-obi nke ob͕eye n’aka ndi nēme ihe ọjọ.

14 Ihe anābu ọnu ka ubọchi ahu bu nke amurum nime ya: ubọchi nke nnem murum, ya ghara ibu nke agọziri agọzi.

15 Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke ziri nnam ozi, si, Amutara gi nwa-nwoke; nēme ka ọ ṅuria ọṅu nke-uku.

16 Ka nwoke ahu di kwa ka obodo nile nke Jehova kwaturu, ghara ichèghari: ya nu kwa iti-nkpu n’ututu, na iti-nkpu agha n’etiti-ehihie;

17 n’ihi na o meghi ka m’nwua site n’afọ nnem; nnem ewe ghọrọm ílì, afọ-ya anēburum mb͕e ebighi-ebi.

18 N’ìhi gini kwa ka m’siri n’afọ nnem puta ihu ọnọdu ọjọ na nwuta, ewe ji ihere me ka ubọchim nile gwusia?

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 21

1 Okwu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e eze, bú Zedekaia, zigara ya Pashua nwa Malkija, na Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, si,

2 Biko, juara ayi Jehova ase; n’ihi na Nebukadreza, bú eze Babilon, ebusowo ayi agha: eleghi anya Jehova gēmeso ayi dika oké ọlu-Ya nile si di, we me ka o si n’aru ayi rigo la.

3 Jeremaia we si ha, Otú a ka unu gāsi Zedekaia:

4 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M’ganēchighari ihe agha nile nke di n’aka-unu, nke unu onwe-unu ji ebuso eze Babilon na ndi Kaldea agha, bú ndi nānọchigide unu n’agha n’azu mb͕idi obodo, M’gāchikọta kwa ha n’etiti obodo a.

5 Mu onwem gēbuso kwa unu agha n’aka eseteri eseti, na n’ogwe-aka di ike, ọbuná n’iwe, na n’ọnuma, na n’oké iwe.

6 M’gētib͕u kwa ndi bi n’obodo a, ma madu ma anumanu: n’ajọ ọria uku nēfe efe ka ha gānwu.

7 Ma emesia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), M’gēwere Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-orù-ya, na ndim, bú ndi puru n’ajọ ọria ahu nke nēfe efe, pu kwa na mma-agha, na n’oké unwu, fọduru n’obodo a, nye ha n’aka Nebukadreza, bú eze Babilon, na n’aka ndi-iro-ha, na n’aka ndi nāchọ ndu-ha: ọ gēji kwa ọnu mma-agha tib͕u ha; ọ gaghi-emere ha ebere, ọ gaghi-enwe kwa ọmiko, ọ gaghi-enwe kwa obi-ebere.

8 Ndi nka ka i gāsi kwa, Otú a ka Jehova siri: Le, M’nēche n’iru unu uzọ ndu na uzọ ọnwu.

9 Onye nānọgide n’obodo a gānwu site na mma-agha, na site n’oké unwu, na site n’ajọ ọria nēfe efe: ma onye nāpu apu, nke nādakuru ndi Kaldea ndi nānọchigide unu n’agha, ọ gādi ndu, ndu-ya ewe ghọrọ ya ihe-nkwata.

10 N’ihi na edowom irum n’aru obodo a ime ya ihe ọjọ, ọ bughi ime ya ezi ihe, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): n’aka eze Babilon ka agēnye ya, ọ gēsure kwa ya n’ọku.

11 Ma okwu bayere ulo eze Juda, nurunu okwu Jehova:

12 unu ulo Devid, otú a ka Jehova siri, Kpenu ikpe n’ututu, naputa-kwa-nu onye anapuworo ihe n’ike n’aka onye-nmeb͕u, ka ọnumam we ghara ipu dika ọku, ghara kwa ire ere nke ọ nādighi onye ganēmenyu ya, n’ihi ihe ọjọ nke omume nile unu.

13 Le, Mu nēmegide gi, gi nwayi bi na ndagwurugwu, gi oké nkume nke ebe di lari, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); unu ndi nāsi, Ònye gāridata imegide ayi? ma-ọbu ònye gābata n’ebe-obibi nile ayi?

14 M’gēwere kwa nmehie-unu leta unu dika nkpuru omume nile unu si di, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): M’gēsuye kwa ọku n’oké ọhia-ya, ọ gērichapu kwa ihe nile di ya buruburu.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 22

1 Otú a ka Jehova siri: Rida n’ulo eze Juda, kwue okwu a n’ebe ahu,

2 si, Nuru okwu Jehova, gi eze Juda, onye nānọkwasi n’oche-eze Devid, gi onwe-gi, na ndi-orù-gi, na ndi-gi ndi nābata n’ọnu-uzọ-ama ndia.

3 Otú a ka Jehova siri: Menu ihe ekpere n’ikpe na ezi omume, naputa-kwa-nu onye anapuworo ihe n’ike n’aka onye-nmeb͕u: unu emejọ-kwa-la ọbìa, ma-ọbu nwa-nb͕ei, ma-ọbu nwanyi di-ya nwuru, unu emela ha ihe-ike, unu awusi-kwa-la ọbara nēmeghi ihe ọjọ n’ebe a.

4 N’ihi na ọ buru na unu eme ihe a n’ezie, ndi-eze ndi nānọchi Devid n’oche-eze-ya gābata kwa n’ọnu-uzọ-ama nke ulo a, bú ndi nānọkwasi n’ub͕ọ-ala na n’inyinya, ya onwe-ya, na ndi-orù-ya, na ndi-ya.

5 Ma ọ buru na unu anughi okwu ndia, ejiwom Onwem ṅu iyi, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na nkpọnkpọ ebe ka ulo a gāghọ.

6 N’ihi na ihe di otú a ka Jehova kwuru bayere ulo eze Juda, si: Gilead ka i burum, bú isi Lebanon: ma aghaghm ime gi ka i ghọ ọzara, na obodo nke madu nēbighi.

7 M’gēdo kwa ndi-nbibi nsọ imegide gi, onye ọ bula na ihe-agha-ya: ha gēb͕utu kwa osisi cedar gi nile kachasi nma, me ka ha dakwasi n’ọku.

8 Ọtutu mba gāgabiga kwa n’akuku obodo a, ha gāsirita kwa ibe-ha n’otù n’otù, N’ìhi gini ka Jehova meworo obodo uku a otú a?

9 Ha gāsi kwa, Ọ bu n’ihi na ha rapuru ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-ha, we kpọ isi ala nye chi ọzọ di iche iche, fè ha.

10 Unu akwalara onye nwuru anwu ákwá, unu egosi-kwa-la ya ebere unu nwere n’aru ya: kwasierenu onye-ije ahu ike; n’ihi na ọ gaghi-alata kwa ọzọ, ọ gaghi-ahu kwa ala amuru ya ọzọ.

11 N’ihi na okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere Shalum nwa Josaia, bú eze Juda, nke bu eze n’ọnọdu Josaia, bú nna-ya, nke siri n’ebe a pua, si: Ọ gaghi-alata kwa n’ebe ahu ọzọ;

12 kama n’ebe ahu nke ha mere ya ka ọ je biri, n’ebe ahu ka ọ gānwu, ma ala nka ka ọ nāgaghi-ahu kwa ọzọ.

13 Ahuhu gādiri onye ji ajọ omume ewu ulo-ya, nke ji kwa ikpé nēzighi ezi ewu ime-elu-ya nile; nke nēme ka madu-ibe-ya fè òfùfè n’efu, ọ dighi-enye kwa ya ugwọ-ọlu-ya;

14 onye nāsi, M’gēwuru onwem ulo uku na ime-ulo-elu di iche iche sara mbara, onye nēmere onwe-ya ka window-ya sa mbara; eji kwa osisi cedar machita elu-ya, eji kwa ihe-otite nācha uhie uhie te ya.

15 Ì gābu eze, n’ihi na gi onwe-gi nānu ọku n’obi ika ndi ọzọ n’iji osisi cedar ewu ulo? nna-gi, ò righi ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, me kwa ihe ekpere n’ikpe na ezi omume? mb͕e ahu ka ọ diri ya nma.

16 O kpere ikpe onye ewedara n’ala na ob͕enye; mb͕e ahu ka ọ di nma. Nka abughi imaram? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

17 Ma anya-gi abua na obi-gi adighi n’ihe ọ bula ma-ọbughi nání n’urù nēzighi ezi gi, na n’iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ, na n’imeb͕u emeb͕u, na n’izọpia-azọpia, ime ya.

18 N’ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, si: Ha agaghi-etiri ya aka n’obi, si, Éwù, nwa-nnem nwoke! ma-ọbu, Éwù, nwa-nnem nwanyi! ha agaghi-etiri ya aka n’obi, si, Éwù, onye-nwe-ayi! ma-ọbu, Éwù, ebube-ya!

19 Olìlì nke inyinya-ibu ka agēji lìe ya, agādọrọ ya, tufue ya n’ebe di anya n’azu ọnu-uzọ-ama Jerusalem.

20 Rigo na Lebanon, ti kwa nkpu; me kwa ka olu-gi da udà na Beshan: si kwa n’Abarim tie nkpu; n’ihi na etipiawo ndi nile nāhu gi-ri n’anya.

21 Agwaram i okwu n’udo-gi; ma i siri, M’gaghi-anu. Nka bu uzọ-gi site na mb͕e i di na nwata, na i geghi nti olum.

22 Ndi-ọzùzù-aturu-gi nile ka ifufe gāzù dika aturu, ndi nāhu gi n’anya gēje na ndota-n’agha: n’ezie mb͕e ahu ka ihere gēme gi, agētiye kwa gi n’ọnọdu-ihere, site n’ihe ọjọ gi nile.

23 Gi nwanyi nēbi na Lebanon, nke nālu akwu-gi n’etiti osisi cedar nile, le, ka i si buru onye agēmere amara nke-uku mb͕e ihe-nb͕u nābiakwasi gi, nb͕ali dika nke nwanyi ime nēme!

24 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ọ buru si na Konaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, bu nb͕a-aka-akàrà n’aka-nrim, ma ọbuná n’ebe ahu ka M’gādọpu gi;

25 M’gēnye kwa gi n’aka ndi nāchọ ndu-gi, na n’aka ndi gi onwe-gi nātu ujọ ha, bú n’aka Nebukadreza, bú eze Babilon, na n’aka ndi Kaldea.

26 M’gētufu kwa gi na nne-gi onye muru gi, rue ala ọzọ, ebe anāmughi unu; ọ bu kwa n’ebe ahu ka unu gānwu.

27 Ma n’ala ahu nke ha onwe-ha nātukwasi nkpuru-obi-ha, si na ha gālaghachi n’ebe ahu, n’ebe ahu ka ha nagaghi-alaghachi.

28 Ọ̀ bu ite elelìri elelì nke etipiara etipia ka nwoke a, bú Konaia, bu? ọ̀ bu ihe nke nādighi-atọ utọ? gini mere eji tufu ha-ri, ya onye-ya na nkpuru-ya, tukwasi ha n’ala nke ha nāmaghi?

29 Ala, ala, ala, nuru okwu Jehova.

30 Otú a ka Jehova siri, Denu nwoke a n’akwukwọ na ọ bu onye b͕a aka nwa, bú nwoke nke ihe nāgaghi-agara nke-ọma n’ubọchi-ya nile: n’ihi na ọ dighi onye ọ bula nime nkpuru-ya ihe gāgara nke-ọma, nke ganānọkwasi n’oche-eze Devid, nāchi kwa achi ọzọ na Juda.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 23

1 Ahuhu gādiri ndi-ọzùzù-aturu ndi nēme ka ìgwè ewu na aturu nke ebe-ita-nrim la n’iyì, kpasa ha; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

2 N’ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke Israel, ji kwue okwu di otú a megide ndi-ọzùzù-aturu ndi nāzù ndim dika aturu, si: Unu onwe-unu akpasawo ìgwè ewu na aturu nkem, chusa ha, unu elekọtaghi kwa ha; le, M’gaje iwere ihe ọjọ nke omume nile unu leta unu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

3 Mu onwem gāchikọta kwa ìgwè ewu na aturu nkem fọduru site n’ala nile ebe M’chusaworo ha, M’gēme kwa ka ha lata n’ebe-ita-nri-ha; ha gāmu kwa ọmùmù, ba uba.

4 M’gēme kwa ka ndi-ọzùzù-aturu biliere ha, ndi gāzù ha: ha agaghi-atu kwa egwu ọzọ, ha agaghi-atu kwa ujọ, agaghi-ele kwa anya otù efu nime ha na o furu efu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

5 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), mb͕e M’gēme ka Ihe-opupú nke nēme ezi omume biliere Devid, otù Eze gābu kwa eze, ọ gēnwe kwa uche, me ihe ekpere n’ikpe na ezi omume n’ala nka.

6 N’ubọchi-ya ka agāzọputa Juda, Israel gēbi kwa na ntukwasi-obi: nka bu kwa aha-ya agākpọ ya, Jehova bu ezi omume-ayi.

7 N’ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na ha agaghi-asi kwa ọzọ, Jehova nādi ndu, bú Onye mere ka umu Israel si n’ala Ijipt rigoputa;

8 kama ha gāsi, Jehova nādi ndu, bú Onye mere ka nkpuru ulo Israel si n’ala Ugwu na n’ala nile ebe M’chusara ha-ri rigoputa, bata; ha gēbi kwa n’elu ala nke aka ha.

9 Okwu bayere ndi-amuma. Obim tiwara etiwa nimem, ọkpukpum nile emewo nkpatu; adiwom ka onye ṅubigaworo manya ókè, na dika nwoke nke manya-vine bàworo n’anya nke-uku; n’ihi Jehova, na n’ihi okwu nsọ Ya nile.

10 N’ihi na ala nka juputara na ndi nākwa iko; n’ihi na site n’ọb͕ub͕a-iyi ala nka nēru újú; ebe-ita-nri nile nke ọzara akpọwo nku; ọb͕ub͕a-ọsọ-ha di kwa njọ, idi-ike-ha abughi kwa ihe ziri ezi.

11 N’ihi na emeruwo ma onye-amuma ma onye-nchu-àjà; e, n’ulom ka M’chọputaworo ihe ọjọ ha; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

12 N’ihi nka uzọ-ha gādi ha ka ebe nālọ alọ n’oké ọchichiri: agāchu ha, ha ewe dabà nime ya: n’ihi na M’gēme ka ihe ọjọ biakwasi ha, n’arọ nleta-ha; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

13 Ọ bu kwa n’aru ndi-amuma Sameria ka M’huworo ihe-nzuzu; ha jiri Beal bu amuma, we me ka ndim, bú Israel, kpafue.

14 Ọzọ, n’aru ndi-amuma Jerusalem ka M’huworo ihe jọb͕uru onwe-ya; ha nākwa iko, nējeghari kwa n’okwu-ugha, ha emewo kwa ka aka ndi nēme ihe ọjọ di ike, ha we ghara isi, onye ọ bula n’ihe ọjọ ya, lata: ha nile aghọworom ihe di ka Sọdọm, ndi bi nime ya aghọwo-kwa-ram ihe di ka Gọmọra.

15 N’ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji kwue okwu di otú a bayere ndi-amuma ndia, si: Le, M’gaje ime ka ha rie wormwood, M’gēme kwa ka ha ṅua miri ńsí; n’ihi na ndi-amuma nke Jerusalem ka nmeru puworo je rue ala nka nile.

16 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Unu egela nti n’okwu nile nke ndi-amuma ahu ndi nēburu unu amuma; ndi nēme unu ihe-efu ka ha bu: ọhù nke obi-ha ka ha nēkwu, ha adighi-ekwu site n’ọnu Jehova.

17 Ha nọ nāsi ndi nēlelìm, Jehova ekwuwo okwu, si, Udo gādiri unu; ọ bu kwa onye ọ bula nke nējeghari n’isi-ike nke obi-ya ka ha siworo, Ihe ọjọ agaghi-abiakwasi unu.

18 N’ihi na ònye guzoworo n’ìzù nzuzo nke Jehova, nke ọ gāhu nu kwa okwu-Ya? ònye ṅaworo okwum nti, we nu ya?

19 Le, oké ifufe Jehova, bú ọnuma-Ya, apuwo, ọbuná oké ifufe nēfesi ike buruburu: n’isi ndi nēmebi iwu ka ọ gēfekwasi si-ike.

20 Iwe Jehova agaghi-alaghachi azu, rue mb͕e O mere ya, ru kwa mb͕e O mere ka ihe-nzube nile nke obi-Ya guzosie ike: na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia unu gāghọta ya nke-ọma.

21 Eziteghm ndi-amuma ahu, ma ha onwe-ha b͕ara ọsọ: agwaghm ha okwu, ma ha onwe-ha buru amuma.

22 Ma ọ buru na ha guzori n’ìzù nzuzo nkem, ha gēmewori ka ndim nuru okwum nile, ha gēmewori kwa ka ha si n’uzọ ọjọ ha na n’ihe ọjọ nke omume nile ha, lata.

23 Ọ̀ bu Chineke nke nọ nso ka M’bu, ghara ibu Chineke nọ n’ebe di anya? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

24 Ọ̀ di onye ọ bula gēzobe onwe-ya n’ebe ọ bula di nzuzo, Mu onwem we ghara ihu ya anya? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta. Ọ̀ bughi elu-igwe na uwa ka M’juputara? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

25 Anuwom ihe ahu nke ndi-amuma siri, bú ndi nēbu amuma agha n’aham, si, Arọwom nrọ, arọwom nrọ.

26 Rùe ole mb͕e ka nka gādi n’obi ndi-amuma ndi nēbu amuma ugha; bú ndi-amuma nke nēbu amuma aghughọ nke obi-ha?

27 Ndi nēchè èchìchè ime ka ndim chezọ aham site na nrọ nile ha nke ha nēzeritara ibe-ha n’otù n’otù, dika ndi bu nna-ha chezọrọ aham site na Beal.

28 Onye-amuma nke nrọ di ya n’ọnu, ya ze nrọ-ya; ọzọ, onye ahu okwum di ya n’ọnu, ya kwue okwum n’ezi-okwu. Gini ka okporo-ọka na ọka wheat nwekọrọ? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

29 Ọ̀ bughi otú a ka ọ di? na okwum di ka ọku, (ọ bu ihe sin’ọnu Jehova puta); na dika otùtù nke nētipia nkume di elu?

30 N’ihi nka, le, Mu nēmegide ndi-amuma, (ọbu ihe si n’ọnu Jehova puta), bú ndi nēzu okwum nile n’ori, onye ọ bula n’aka ibe-ya.

31 Le, Mu nēmegide ndi-amuma, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), bú ndi nēwere ire-ha kwue ihe, si, Ọ bu ihe si Ya n’ọnu puta.

32 Le, Mu nēmegide ndi nēbu amuma nrọ ugha, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ha we ze ha, me ka ndim kpafue site n’okwu-ugha nile ha na n’obi-ha nādighi n’otù ebe: ma Mu onwem eziteghi ha, enyeghkwam ha iwu; ọ dighi kwa urù ha gābara ndi nka ma-ọli; ọ bu ihe si n’onu Jehova puta.

33 Ma mb͕e ndi nka, ma-ọbu onye-amuma, ma-ọbu onye-nchu-àjà, gāju gi, si, Gini bu ibu Jehova nēbo? I gasi kwa ha, Gini bu ibu? ọ bu na arapuwom unu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

34 Ma onye-amuma ahu, ma-ọbu onye-nchu-àjà ahu, ma-ọbu ndi ahu, nke gāsi, Le, ibu Jehova nēbo: M’gēwere kwa nmehie-ya leta nwoke ahu, leta kwa ulo-ya.

35 Otú a ka unu gāsirita ibe-unu n’otù n’otù, sirita kwa nwa-nne-unu n’otù n’otù, Gini ka Jehova zaworo? na, Gini ka Jehova kwuworo?

36 Ma ibu Jehova ka unu nāgaghi-ehota kwa ọzọ: n’ihi na ibu eboro onye ọ bula bu okwu nke aka ya; unu ab͕anwewo kwa okwu nile nke Chineke di ndu, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke-ayi.

37 Otú a ka i gāsi onye-amuma, Gini ka Jehova zaworo gi? na, Gini ka Jehova kwuworo?

38 Ma ọ buru na unu asi, Le, ibu Jehova nēbo; n’ihi nka ka Jehova ji si otú a: N’ihi na unu ekwuwo okwu a, si, Le, ibu Jehova nēbo, ma eziteworom unu ozi, si, Unu asila, Le, ibu Jehova nēbo;

39 n’ihi nka, le, Mu onwem, M’gēchezọsi kwa unu, chupu unu na obodo ahu nke M’nyere unu, nye kwa nna-unu-hà, n’irum:

40 M’gētiyekwasi kwa unu ita-uta di mb͕e ebighi-ebi, ya na itiye n’ọnọdu-ihere di mb͕e ebighi-ebi, nke agaghi-echezọ echezọ.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 24

1 Jehova we me ka m’hu, ma, le, nkata fig abua adọbara n’iru ulo uku nke Jehova; mb͕e Nebukadreza, bú eze Babilon, mesiri ka Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, na ndi-isi Juda, na ndi-ọ̀kà, na ndi-uzú, si na Jerusalem je biri n’ala ọzọ, we me ka ha biarue Babilon.

2 Fig nke di nma nke-uku di n’otù nkata, dika fig nke buru uzọ cha: ma fig nke jọrọ njọ nke-uku di na nkata nke-ọzọ, nke anāgaghi-eri, site n’ijo-njọ-ha.

3 Jehova we sim, Gini ka onwe-gi nāhu, Jeremaia? M’we si, Fig; ndi bu ezi fig di nma nke-uku; ma ndi bu fig ọjọ jọrọ njọ nke-uku, nke anāgaghi-eri eri, site n’ijọ-njọ-ha.

4 Okwu Jehova we ruem nti, si,

5 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri; Dika ezi fig ndia, otú a ka M’gāmata ndi Juda emere ka ha je biri n’ala ọzọ, ndi M’siri n’ebe a ziga n’ala ndi Kaldea, ime ha nma.

6 N’ihi na M’gātukwasi ha anyam ime ha nma, M’gēme kwa ka ha lata n’ala nka: M’gēwu kwa ha dika ulo, ghara ikwada ha; M’gāku kwa ha dika osisi, ghara iropu ha.

7 M’gēnye kwa ha obi imaram, na Mu onwem bu Jehova: ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke: n’ihi na ha gēji obi-ha nile laghachikutem.

8 Ma dika fig ọjọ ndia, nke anāgaghi-eri eri, site n’ijọ-njọ-ha; n’ezie otú a ka Jehova siri, Otú a ka M’gēwere Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-isi-ya, na ndi Jerusalem fọduru, bú ndi fọduru n’ala nka, na ndi bi n’ala Ijipt, nye:

9 M’gēwere ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, iburu ha ihe ọjọ; ibu ihe-ita-uta, na ilu, na ihe-àkùkù, na ihe-nkọcha, n’ebe nile M’gāchusa ha.

10 M’gēziga kwa mma-agha na oké unwu na ajọ ọria nēfe efe n’etiti ha, rue mb͕e agēme ka ha gwupusia n’elu ala ahu nke M’nyere ha, nye kwa ndi bu nna-ha.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 25

1 Okwu nke ruru Jeremaia nti bayere ndi Juda nile n’arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda; nke ahu bu arọ mbu nke Nebukadreza, bú eze Babilon;

2 bú okwu nke Jeremaia, bú onye-amuma, gwara ndi Juda nile, gwa ndi nile bi na Jerusalem, si:

3 Site n’arọ nke-iri-na-atọ nke Josaia nwa Emon, bú eze Juda, we rue ta, orú arọ na ato ndia, ka okwu Jehova ruworom nti, m’we gwa unu, nēbili n’isi-ututu nēkwu; ma unu anughi.

4 Jehova ezitewo-kwa-ra unu ndi-orù-Ya nile, bú ndi-amuma, nēbili n’isi-ututu nēzite ha; ma unu anughi, unu atọghi kwa nti-unu n’ala inu;

5 nāsi, Biko, latanu, onye ọ bula ya si n’uzọ ọjọ ya na n’ihe ọjọ nke omume nile unu lata, biri-kwa-nu n’elu ala nke Jehova nyere unu, nye kwa nna-unu-hà, site na mb͕e ebighi-ebi gara aga we rue mb͕e ebighi-ebi di n’iru:

6 unu ejeso-kwa-la chi ọzọ ifè ha na ikpọ isi ala nye ha, unu eji-kwa-la ọlu aka-unu kpasum iwe; M’gaghi-eme kwa unu ihe ọjọ.

7 Ma egeghm nti, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ka unu we were ọlu aka-unu kpasuem iwe, ime onwe-unu ihe ọjọ.

8 N’ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji si otú a: N’ihi na unu anughi okwum nile,

9 le, M’gaje iziga chiri ab͕uru nile nke Ugwu, (ọ̀ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ọ bu kwa Nebukadreza, bú eze Babilon, bú orùm, ka M’gēzigara ozi, M’gēme kwa ka ha bia imegide ala nka, na imegide ndi bi ya, na imegide mba nile ndia nọ ya buruburu; M’gēwezuga kwa ha ka ebibie ha, M’gēme kwa ha ka ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na nkpọnkpọ ebe di mb͕e ebighi-ebi.

10 Ọzọ, M’gēme ka olu obi-utọ, na olu ọṅù, na nwoke nālu nwunye ọhu, na olu nwanyi anālu ọhu, na olu nkume-igwe-nri, na ìhè oriọna, lanari ha n’iyì.

11 Ala nka nile gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe na ihe-iju-anya; mba ǹdia gēfè kwa eze Babilon ọgu arọ na iri.

12 O gēru kwa, mb͕e ọgu arọ na iri ruzuru, na M’gēwere ajọ omume ha leta eze Babilon, leta kwa mba ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), leta kwa ala Kaldea; M’gēme kwa ya ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu mb͕e ebighi-ebi.

13 M’gēme kwa ka okwum nile biakwasi ala ahu, bú okwu nke M’kwuworo megide ya, bú amuma nile edeworo n’akwukwọ a, nke Jeremaia buworo megide mba nile.

14 N’ihi na ọtutu mba na ndi-eze nke di uku gēme ka ha fè ha òfùfè, ọbuná ha onwe-ha: M’gākwughachi kwa dika omume nile ha si di, na dika ọlu nke aka-ha si di.

15 N’ihi na otú a ka Jehova, bu Chineke nke Israel, sirim: Nara iko manya nke ọnuma nka n’akam, me ka mba nile ṅua ya, bú ndi Mu onwem nēziga gi jekuru.

16 Ha gāṅu kwa, we ṅaghari, wi ara, n’ihi mma-agha ahu nke Mu onwem nēziga n’etiti ha.

17 M’we nara iko ahu n’aka Jehova, me ka mba nile ṅua, bú ndi Jehova zigaram jekuru:

18 bú Jerusalem, na obodo nile nke Juda, na ndi-eze-ya, na ndi-isi-ya, ime ha nkpọnkpọ ebe, na ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na ihe-nkọcha; dika o si dì ta;

19 Fero, bú eze Ijipt, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-ya nile;

20 na ndi nile gwara, ọgwa na eze nile nke ala Uz, na eze nile nke ala ndi Filistia, na Ashkelon, na Geza, na Ekron, na ndi Ashdod fọduru;

21 na Edom, na Moab, na umu Amon;

22 na eze nile nke Taia, na eze nile nke Zaidon, na ndi-eze nke agwe-etiti nke di n’ofè oké osimiri;

23 Dedan, na Tima, na Buz, na ndi nile akọpuworo usọ isi-ha;

24 na eze nile nke Arebia, na eze nile nke ndi gwara ọgwa ndi bi n’ọzara;

25 na eze nile nke Zimri, na eze nile nke Ilam, na eze nile nke Midia;

26 na eze nile nke Ugwu, ma ndi bi nso ma ndi bi n’ebe di anya, onye na ibe-ya; na ala-eze nile nke uwa, nke di n’elu uwa: eze Shishak gāṅuso kwa ha.

27 I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ṅuanu, ṅubiga ókè, b͕ọ ab͕ọ, da, unu ebili-kwa-la ọzọ, n’ihi mma-agha ahu nke Mu onwem nēziga n’etiti unu.

28 Ọ gēru kwa, mb͕e ha gāju inara iko ahu n’aka-gi iṅu, na i gāsi ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Unu aghaghi iṅu.

29 N’ihi na, le, ọ bu n’obodo ahu nke akpọkwasiri aham ka Mu onwem nāmalite ime ihe ọjọ, ma unu onwe-unu, ùnu gābu ndi anāmaghi ikpe ma-ọli? Unu agaghi-abu ndi anāmaghi ikpe: n’ihi na mma-agha ka Mu onwem nākpọ ka ọ dakwasi ndi nile bi n’uwa; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.

30 Ma gi onwe-gi gēburu ha amuma okwu nile ndia, si ha Jehova gēsi n’elu bib͕ọ, si kwa n’ebe-obibi-Ya di nsọ me ka olu-Ya da udà; Ọ gēbib͕osi ebe-ita-nri-Ya ike; nkpu dika ndi nāzọcha nkpuru-vine ka Ọ gēti imegide ndi nile bi n’uwa.

31 Nkpọtu nābiaru nsọtu uwa; n’ihi na Jehova nwere okwu-ikpé megide mba nile, Ya na anu-aru nile, bú madu, ganēje ikpe; ma ndi nēmebi iwu, Ọ’gēwere ha nye mma-agha; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

32 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Le, ihe ọjọ nāpu si n’otù mba jerue mba ọzo, agākpọte kwa oké ifufe site na nsọtu nile nke uwa.

33 Ndi Jehova b͕uru gādizu kwa n’ubọchi ahu site n’otù nsọtu uwa we rue nsọtu ọzọ nke uwa: agaghi-etiri ha aka n’obi, agaghi-achikọta kwa ha, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu n’elu ala ka ha gāghọ.

34 Kwasienu ákwá ike, unu ndi-ọzùzù-aturu, ti-kwa-nu nkpu; turu-kwa-nu na ntu, unu ndi di ebube n’etiti ìgwè ewu na aturu: n’ihi na ubọchi-unu eruzuwo ka eb͕ue unu, M’gākpasa kwa unu, unu gāda kwa dika ihe anāchọsi ike.

35 Ebe-nb͕alaga alanariwo kwa ndi-ọzùzù-aturu, nb͕apu alanariwo ndi di ebube n’etiti ìgwè ewu na aturu.

36 Ge nti olu iti-nkpu nke ndi-ọzùzù-aturu, na nke ikwasi-ákwá-ike nke ndi di ebube n’etiti ìgwè ewu na aturu! n’ihi na Jehova nēbibi ebe-ita-nri-ha.

37 Emewo kwa ka ulo-obibi nile nke di n’udo dere du site n’iwe di ọku nke Jehova.

38 Ọ rapuwo okwu-ọhia-Ya, dika ọdum: n’ihi na ala-ha aghọwo ihe-iju-anya site n’idi-ọku nke mma-agha nēme ihe-ike, na site n’iwe-Ya di ọku.