Categories
AISAIA

AISAIA 62

1 N’ihi Zaion m’gaghi-edebe ọnum du, na n’ihi Jerusalem m’gaghi-anọ jū, rue mb͕e ezi omume-ya gāputa ihè dika onwu-maramara, nzọputa-ya kwa dika ọwa nke nēnwu enwu.

2 Mba di iche iche gāhu kwa ezi omume-gi, eze nile gāhu nsọpuru-gi: agākpọ kwa gi aha ọhu nke ọnu Jehova gāgu.

3 I gāghọ kwa okpu-eze nke ima-nma n’aka Jehova, na ákwà-ike-n’isi nke ala-eze n’ọbu-aka Chineke-gi.

4 Agaghi-agu kwa gi aha Nwanyi arapuru arapu ọzọ; agaghi-agukwa ala-gi aha Ala tọb͕ọrọ n’efu ọzọ: n’ihi na gi ka agākpọ Hefzi-ba, agākpọ kwa ala-gi Beula: n’ihi na ihe-gi nātọ Jehova utọ, agālu kwa ala-gi dika nwunye.

5 N’ihi na dika nwa-okorọbia si aluru nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, otú a ka umu-gi ndikom gālu gi: ọzọ, dika obi-utọ nke onye nālu nwunye ọhu nwere n’aru nwunye ọhu ya, otú a ka obi gātọ Chineke utọ n’aru gi.

6 N’elu mb͕idi-gi nile, Jerusalem, ka M’doworo ndi-nche; ogologo ubọchi nile ehihie na abali, mb͕e nile, ha agaghi-edebe ọnu-ha du: unu ndi nēchetara Jehova ihe, unu ederela du,

7 unu ekwe-kwa-la ka O dere du, rue mb͕e Ọ gēme ka Jerusalem guzosie ike, ru kwa mb͕e Ọ gēme ya ka ọ buru otuto n’uwa.

8 Jehova ewerewo aka-nri-Ya, were kwa ogwe-aka-Ya di ike, ṅua iyi, si, N’ezie M’gaghi-enye kwa ọka-gi ọzọ iburu ndi-iro-gi ihe-oriri ma-ọli; n’ezie umu ala ọzọ agaghi-aṅu kwa manya-vine ọhu gi, nke i dọb͕uworo onwe-gi n’ọlu bayere ya:

9 kama ndi chikọtaworo ya gēri ya, we to Jehova; ndi kpokọtaworo ya gāṅu kwa ya n’ogige nsọm nile.

10 Gabiganu, gabiganu n’ọnu-uzọ-ama nile; dozienu uzọ ndim; tulienu, tulienu uzọ atuliri atuli; tutupunu nkume; bulienu ọkọlọtọ n’elu ndi nile di iche iche.

11 Le, Jehova emewo ka anuru ya rue nsọtu uwa, si, Sinu ada Zaion, Le, nzọputa-gi abiawo; le, ọkwukwu-ugwọ-Ya di n’aka-Ya, ugwọ-ọlu-Ya di kwa n’iru Ya.

12 Ha gākpọkwa ha Ndi nsọ ahu, Ndi Jehova b͕aputaworo: agākpọ kwa gi Obodo achọputara achọputa, Obodo anārapughi arapu.

Categories
AISAIA

AISAIA 63

1 Ònye bu nka nēsi n’Edom bia, yiri uwe nācha ọbara-ọbara site na Bọzra? Ònye a nke mara nma n’uwe-oyiyi-Ya, nāzọ ije n’iba-uba nke ike-Ya? Ọ bu Mu onwem nke nēkwu okwu n’ezi omume, di ike izọputa.

2 Gini mere ọ nācha uhie uhie n’uwe-oyiyi-Gi? gini mere uwe-Gi ji di ka onye nāzọ ukwu n’ebe-inara-manya-vine?

3 Ebe-nzọcha-nkpuru-vine ka M’zọchara, náním; ma nime ndi nile di iche iche ọ dighi onye ọ bula Mu na ya nọ: M’we zọcha ha n’iwem, zọda ha n’ọnumam; ọbara-ndu-ha we fesa n’uwem nile, ọ bu kwa uwe-oyiyim nile ka M’meruru emeru.

4 N’ihi na ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀ di n’obim, arọ nke ndi M’b͕aputaworo abiawo kwa.

5 M’we legide anya, ma ọ dighi onye nēne aka; ibobo we nwuam n’aru na ọ̀ dighi onye nākwagide: ogwe-akam we wetaram nzọputa; ọnumam kwa, ya kwagiderem.

6 M’we zọda ndi di iche iche n’iwem, me ka ha ṅubiga ihe-ọṅuṅu nābà n’anya n’ọnumam, M’we me ka ọbara-ndu-ha ruda n’ala.

7 Ebere nile nke Jehova ka M’gēhota, ha na otuto nile nke Jehova, dika ihe nile si di nke Jehova mesoworo ayi; na iba-uba nke ezi ihe emere ulo Israel, nke O mesoworo ha dika obi-ebere-Ya nile si di, na dika iba-uba nke ebere-Ya si di.

8 O we si, N’ezie, ndim ka ha bu, umu ndi nādighi-ekwu okwu-ugha: O we ghọrọ ha onye-nzọputa.

9 Na nkpab͕u nile ha Ya ka anākpab͕u, ọ bu kwa mọ-ozi nke iru-Ya zọputara ha: n’ihu-n’anya-Ya na n’ọmiko-Ya Ya onwe-ya b͕aputara ha; O we palie ha, kuru ha ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.

10 Ma ndi ahu nupuru isi, me ka o wuta Mọ Nsọ Ya: O we chigharia ghọrọ ha onye-iro, Ya onwe-ya busoro ha agha.

11 Ndi-Ya we cheta ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga nke Moses, si, Òle ebe Onye ahu nọ nke mere ka ha si n’oké osimiri rigoputa n’aka onye nāzù ìgwè ewu na aturu-Ya? òle ebe Onye ahu nọ nke tiyere Mọ Nsọ Ya n’etiti ha?

12 Nke nēme ka ogwe-aka-Ya mara nma je ije n’aka-nri Moses? Nke nēkewa miri n’iru ha, imere Onwe-ya aha ebighi-ebi?

13 Nke nēme ka ha je ije n’ob͕u-miri dika inyinya n’ọzara, ha we ghara isu ngọngọ?

14 Dika anu-ulo nke nārida na ndagwurugwu, otú a ka Mọ nke Jehova nēme ka ha zuru ike: otú a ka I duru ndi-Gi, imere Onwe-gi aha mara nma.

15 Si n’elu-igwe legide anya, si kwa n’ebe-obibi nke idi-nsọ-Gi na nke ima-nma-Gi le: òle ebe ekworo-Gi na idi-ike-Gi nile di? idà-udà nke ngiri-afọ-Gi na obi-ebere-Gi nile n’ebe m’nọ jisiri onwe-ha ike.

16 N’ihi na Gi onwe-gi bu Nna-ayi; n’ihi na Abraham amaghi ayi, Israel adighi-amata kwa ayi: Gi onwe-gi, Jehova, bu Nna-ayi; Onye-nb͕aputa-ayi site na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka aha-Gi bu.

17 Jehova, n’ìhi gini ka I nēme ka ayi si n’uzọ-Gi nile kpafue? n’ìhi gini ka I nēme ka obi-ayi si n’egwu-Gi sie ike? Lata n’ihi ndi-orù-Gi, bú ebo nile nke ihe-nketa-Gi.

18 Ọ bu nání mb͕e ntà ka ndi nsọ Gi nwetara ya: ndi nākpab͕u ayi azọdawo ebe nsọ Gi.

19 Ayi aghọwo ndi I nāchighi site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ndi anākpọkwasighi ha aha-Gi.

Categories
AISAIA

AISAIA 64

1 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I gādọwa elu-igwe, ridata, ma asi na ugwu nile gēsi n’iru Gi rùda dika miri;

2 dika mb͕e ọku nāb͕a umu osisi, dika mb͕e ọku nēme ka miri b͕ọ: ime ka ndi nēmegide Gi mara aha-Gi, ka mba di iche iche we si n’iru Gi ma jijiji.

3 Mb͕e I mere ihe di egwu nke ayi nēleghi anya ha, I ridatara, ugwu nile siri n’iru-Gi rùda dika miri.

4 Ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi gara aga madu anughi, ha anutaghi kwa na nti, anya ahughi kwa otù Chineke, ma ewezuga nání Gi, Nke nāluru onye nēchere Ya ọlu.

5 I zutewo onye nēwere obi-utọ alu ezi omume, bú ndi nēcheta Gi n’uzọ-Gi nile: le, Gi onwe-gi were iwe, ayi we mehie: nime ha ka ayi nọworo mb͕e ebighi-ebi, àgāzọputa kwa ayi?

6 Ayi we di ka onye ruru árú, ayi nile; na dika uwe emeruru emeru, otú a ka ezi omume nile ayi di: ayi we kpọnwua dika akwukwọ osisi, ayi nile; ajọ omume-ayi nēfepu kwa ayi, dika ifufe.

7 Ọ dighi kwa onye nākpọku aha-Gi, nke nākpọte onwe-ya ijide Gi: n’ihi na I zonariwo ayi iru-Gi, we me ka ayi b͕aze site n’aka ajọ omume nile nke ayi.

8 Ma ab͕ua a, Jehova, Nna-ayi ka I bu: ayi onwe-ayi bu urọ, Gi onwe-gi bu onye nākpu ayi; ọlu aka-Gi ka ayi nile bu.

9 Jehova, ewela iwe nke-uku, echeta-kwa-la ajọ omume rue mb͕e ebighi-ebi: le, biko, legide anya, ndi-Gi ka ayi nile bu.

10 Obodo nsọ Gi nile aghọwo ọzara, Zaion aghọwo ọzara, Jerusalem aghọwo ebe tọb͕ọrọ n’efu.

11 Ulo-ayi nke di nsọ nke ma-kwa-ra nma, ebe nna-ayi-hà toro Gi, aghọwo ihe nsure-ọku: ihe nile ayi anāchọsi ike aghọwo kwa nkpọnkpọ ihe.

12 Mb͕e anēme ihe ndia, Ì gējisi Onwe-gi ike, Jehova? Ì gāb͕a nkiti, we weda ayi n’ala nke-uku?

Categories
AISAIA

AISAIA 65

1 Ekwerem ka ndi nājughi ajuju chọm; ekwerem ka ndi nāchọsighm ike chọtam: asirim otù mba nke nākpọkughi aham, Lekwam.

2 Ab͕asawom akam abua ogologo ubọchi nile nye otù ndi nke nēwezuga onwe-ha, ndi nēje ije n’uzọ nādighi nma, nēso èchìchè nile nke aka ha;

3 bú ndi ahu nke nākpasum iwe n’irum mb͕e nile, nāchu àjà n’ubi nile agbara-ogige, nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’elu brick nile;

4 ndi nānọdu n’etiti ílì, nānọ kwa ọnọdu-abali n’ebe nile echebeworo na nzuzo; ndi nēri anu ezì, ofé nke ihe-árú di iche iche di kwa n’ihe-isi-ite nile ha;

5 ndi nāsi, Guzoro onwe-gi iche, abiarula nsom, n’ihi na edowom i ihe nsọ: ndia bu anwuru-ọku n’imim, ọku nke nēre ogologo ubọchi nile.

6 Le, ọ bu ihe edeworo n’akwukwọ n’irum: M’gaghi-agba nkiti, kama M’gākwughachi, e, M’gākwughachi n’obi-ha,

7 ajọ omume nile nke unu na ajọ omume nile nke ndi bu nna-unu n’otù, ka Jehova siri, bú ndi sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’elu ugwu nile, takwam uta n’elu ugwu ntà nile: M’gēbu kwa uzọ tùa ọlu-ha n’obi-ha.

8 Otú a ka Jehova siri, Dika anāchọta manya-vine ọhu n’uyọkọ nkpuru-vine, ewe si, Ebibila ya, n’ihi na ngọzi di nime ya: otú a ka M’gēme N’ihi ndi-orùm, ka M’we ghara ibibi ha nile.

9 M’gēme kwa otù nkpuru ka o si na Jekob puta, na otù onye-nnweta nke ugwum nile ka o si na Juda puta: ndi M’rọputaworo ewe nweta ya, ndi-orùm gēbi kwa n’ebe ahu.

10 Sheron gāghọ kwa ebe-ita-nri nke ìgwè ewu na aturu, ndagwurugwu Ekoa gāghọ kwa ebe ìgwè ehi nāmakpu amakpu. diri ndim chọworom.

11 Ma unu onwe-unu ndi nārapu Jehova, ndi nēchezọ ugwu nsọm, ndi nēdoro Gad table n’usoro, ndi nāb͕ajuru Meni manya gwara ọgwa;

12 M’gāgukọta unu nye mma-agha, unu nile gēruru kwa ala ka ewe b͕ue unu; n’ihi na akpọrọm unu òkù, ma unu azaghm; ekwurum okwu, ma unu anughi; unu we me ihe jọrọ njọ n’anyam abua, ọ bu kwa ihe nke nātọghm utọ ka unu rọputara.

13 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji kwue otú a, si, Le, ndi-orùm gēri ihe, ma agu gāgu unu onwe-unu: le, ndi-orùm gāṅu, ihe-ọṅuṅu, ma akpiri gākpọ unu onwe-unu nku: le, ndi-orùm gāṅuri ọṅu, ma ihere gēme unu onwe-unu:

14 le, ndi-orùm gēti nkpu ọṅù site n’obi di nma, ma unu onwe-unu gēti nkpu site n’ihe-nb͕u nke obi, unu gēsite kwa na ntiwa nke mọ-unu kwasi ákwá ike.

15 Unu gārapu aha-unu n’azu ighọrọ ndi M’rọputaworo ihe-ọb͕ub͕a-iyi, Onye-nwe-ayi Jehova gēme kwa ka i nwua; ma Ọ gākpọ ndi-orù-Ya aha ọzọ:

16 onye ahu nke nāgọzi onwe-ya n’uwa ewe gọzie onwe-ya nime Chineke nke ezi-okwu; onye ahu kwa nke nāṅu iyi n’uwa gēji Chineke nke ezi-okwu ṅua; n’ihi na echezọwo ahuhu mbu nile, na n’ihi na ezonariwo ha n’anyam abua.

17 N’ihi na, le, M’gaje ikè elu-igwe ọhu na uwa ọhu: agaghi-echeta kwa ihe mbu nile, ha agaghi-abata kwa n’obi.

18 Ma otú ọ di, ka obi tọ unu utọ, teghari-kwa-nu egwú ọṅù rue mb͕e ebighi-ebi n’ihi ihe nke Mu onwem nēkè: n’ihi na, le, M’nēkè Jerusalem ibu ihe nteghari-egwú-ọṅù, ndi-ya kwa, ibu ihe obi-utọ.

19 M’gēteghari kwa egwú ọṅù n’aru Jerusalem, obi gātọkwam utọ n’aru ndim: agaghi-anu kwa olu ikwa-ákwá nime ya ọzọ, ma-ọbu olu iti-nkpu.

20 Ọ dighi nwa ọhu nwuchuru anwuchu gēsite kwa n’ebe ahu ọzọ, ma-ọbu agadi nke nānọzughi ubọchi ndu-ya: n’ihi na nwata gānwu mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise, agākọcha kwa onye-nmehie mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise.

21 Ha gēwu kwa ulo, biri nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, rie nkpuru-ha.

22 Ha agaghi-ewu ulo, onye ọzọ ebichie; ha agaghi-aku, onye ọzọ erie: n’ihi na dika ubọchi nile nke osisi si di, otú a ka ubọchi nile nke ndim gādi, ndi M’rọputaworo gēnwe kwa ihe aka-ha lutara mb͕e di anya nke-uku.

23 Ha agaghi-adọb͕u onwe-ha n’ọlu n’efu, ha agaghi-amu umu nye obi-ọlulọ-miri: n’ihi na nkpuru nke ndi Jehova gọziworo ka ha bu, ha na umu gēsi n’aru-ha puta.

24 O gēru kwa na, tutu ha akpọ, Mu onwem gāza; mb͕e ha onwe-ha nọ nēkwu okwu, Mu onwem gānu.

25 Anu-ọhia wolf na nwa-aturu gātakọ nri n’otù, ọdum gāta kwa ahihia dika ehi: ma agwọ, ájá gābu nri-ya. Ha agaghi-eme ihe ọjọ, ha agaghi-ebibi kwa, n’ugwu nsọm nile, ka Jehova siri.

Categories
AISAIA

AISAIA 66

1 Otú a ka jehova siri, Elu-igwe bu oche-ezem, uwa bu kwa ihe-nb͕akwasi-ukwum: àha ulo gini ka unu gēwurum? ma-ọbu àha ebe gini gābu ebe-izu-ikem?

2 N’ihi na ihe nile ndia ka akam meworo, ihe ndia nile ewe di, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta: ma onye a ka M’gēlegide, ọbuná onye ewedara n’ala nke etib͕u-kwa-ra mọ-ya etib͕u, onye nāma kwa jijiji n’okwum.

3 Onye nēb͕u ehi di ka onye nētib͕u madu; onye ji nwa-aturu achu àjà di ka onye nāb͕aji olu nkita; onye nēsure àjà-nsure-ọku, bú onyinye-inata-iru-ọma, di ka onye nēsure ọbara ezì; onye nēsure frankincense ka ọ buru ihe-ncheta di ka onye nāgọzi ajọ ihe: e, ndi ahu arọputawo uzọ nile nke aka ha, ọ bu kwa ihe-árú nile ha nātọ nkpuru-obi-ha utọ;

4 Mu onwem gārọputa kwa ichì-ọchì nile ha, me kwa ka ihe-ujọ nile ha biakwasi ha; n’ihi na M’kpọrọ òkù, ma ọ dighi onye nāza; ekwurum okwu, ma ha anugh: ha we me ihe jọrọ njọ n’anyam, ọ bu kwa ihe ahu nke nātọghm utọ ka ha rọputara.

5 Nurunu okwu Jehova, unu ndi nama jijiji n’okwu-Ya: Umu-nne-unu ndi nakpọ unu asì, ndi nāchupu unu n’ihi aham, asiwo, Ka asọpuru Jehova, ka ayi we lekwasi ọṅù-unu anya: ma ihere gēme ndi ahu.

6 Ge nti, olu nkpọtu nēsite n’obodo, olu nēsite n’ulo uku Chineke, bú olu Jehova Onye nākwughachi ndi-iro-Ya nmeso-ha.

7 Tutu ime eme ya, ọ muru nwa; tutu ihe-nb͕u nke diri ya abia, ọ muputara nwa-nwoke.

8 Ònye nuworo ihe dika nka? ònye huworo ihe dika ndia? Ìme ala gēme ya n’otù ubọchi? àgāmu mba n’otù mb͕e? n’ihi na ime mere Zaion, ọ mu-kwa-ra umu-ya.

9 Mù onwem gēme ka nwa rue ọmumu, ghara ime ka amua ya? ka Jehova siri: ma-ọbu Mu onwem nke nēme ka amua, M’gēmechi àkpà-nwa? ka Chineke-gi siri.

10 Soronu Jerusalem ṅuria, teghari-kwa-nu egwú ọṅù n’ihi ya, unu ndi nile nāhu ya n’anya: ka obi tọ unu utọ n’ebe ọ nọ site n’obi-utọ, unu ndi nile nēru újú bayere ya:

11 ka unu we ṅujue ara nkasi-obi-ya nile afọ; ka unu we miputa ara, njubiga-ókè nke nsọpuru-ya ewe tọ unu utọ.

12 N’ihi na otú a ka Jehova siri, Le, M’nēsetiru ya udo dika osimiri, na nsọpuru nke mba di iche iche dika iyi nke nērubiga ókè, unu gāmiputa nime ha; n’akuku ka agēkuru unu, ọ bu kwa n’ikperè ka agātughari unu.

13 Dika onye nke nne-ya nākasi obi, otú a ka Mu onwem gākasi unu obi; ọ bu kwa nime Jerusalem ka agākasi unu obi.

14 Unu gāhu kwa ya, o we tọ obi-unu utọ, ọkpukpu nile unu gējuputa na ndu dika ahihia ndu: agāma kwa aka Jehova n’ebe ndi-orù-Ya nọ, Ọ gēwesa kwa ndi-iro-Ya iwe.

15 N’ihi na, le, Jehova gēji ọku bia, ub͕ọ-ala-Ya nile gādi kwa ka oké ifufe; iji ọnuma nyeghachi iwe-Ya, na iji ire ọku nyeghachi ibasi-nba-ike-Ya.

16 N’ihi na ọku ka Jehova gēji soro anu-aru nile, bú madu, je ikpé, Ọ gēji kwa mma-agha-Ya: ndi Jehova b͕uworo gaba uba.

17 Ndi nēdo onwe-ha nsọ ndi nēme onwe-ha ka ha di ọcha ibà n’ubi nile ab͕ara ogige, n’azu otù onye di n’etiti, ndi nēri anu ezì, na ihe-árú ahu, na òké; n’otù ka ha gāgwusi, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

18 Ma Mu onwem, amaram ọlu nile ha na èchìchè nile ha: mb͕e nābia ijikọta mba nile na asusu nile; ha gābia kwa, hu ebubem.

19 M’gēdo kwa ihe-iriba-ama n’etiti ha, si kwa n’etiti ha ziga ndi b͕aputara ab͕aputa ka ha jekuru mba nile, bú Tashish, na Pul, na Lud, ndi nādọ uta, jekuru Tubal na Jevan, jekuru agwe-etiti nile di anya, ndi nānughi ihe bayerem, ndi nāhughi kwa ebubem: ha gēgosi ebubem n’etiti mba nile.

20 Ha gēme kwa umu-nne-unu nile ka ha si na mba nile bia ibu onyinye-inata-iru-ọma enyere Jehova, n’elu inyinya, na n’ub͕ọ-ala, na n’ub͕ọ-ala nwere ihe-okpukpu, na n’elu inyinya mule, na n’elu anu di ngwa, rue ugwu nsọm, bú Jerusalém, ka Jehova siri, dika umu Israel si ewebata onyinye-inata-iru-ọma-ha n’ulo Jehova n’ihe di ọcha.

21 Ọ bu kwa ufọdu nime ha ka M’gēwere ibu ndi-nchu-àjà na ibu ndi Livai, ka Jehova siri.

22 N’ihi na dika elu-igwe ọhu na uwa ọhu, nke Mu onwem nēme, ganēguzo n’irum, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), otú a ka nkpuru-unu na aha-unu gēguzo.

23 Ọ gēru kwa, na site n’otù ọnwa ọhu rue ọnwa ọhu ọzọ, na site n’otù ubọchi-izu-ike rue ubọchi-izu-ike ọzọ, anu-aru nile, bú madu, gābia ikpọ isi ala n’irum, ka Jehova siri.

24 Ha gāpu kwa, lekwasi ozu nile nke ndi nējehie ejehie megidem: n’ihi na ikpuru-ha agaghi-anwu, ọku-ha agaghi-anyu kwa; ha gābu-kwa-ra anu-aru nile ihe isọ oyi.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 1

1 Okwu Jeremaia nwa Hilkaia, onye sitere na ndi-nchu-àjà ndi nọ n’Anatot n’ala Benjamim:

2 onye okwu Jehova ruru nti n’ubọchi Josaia nwa Emon, bú eze Juda, n’arọ nke-iri-na-atọ ọ bu eze.

3 O ru-kwa-ra ya nti n’ubọchi Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, rue mb͕e arọ nke-iri-na-otù nke Zedekaia nwa Josaia, bú eze Juda, gwusiri: rue mb͕e emere ka Jerusalem je biri n’ala ọzọ n’ọnwa nke-ise.

4 Okwu Jehova we ruem nti, si,

5 Tutu akpua m gi n’afọ amaram gi, ọ bu kwa tutu i si n’àkpà-nwa puta ka M’doro gi nsọ; ewerewom gi nye ka gi buru onye-amuma diri mba nile.

6 M we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! le, amaghm ikwu okwu, n’ihi na nwata ka m’bu.

7 Jehova we sim, Asila, Nwata ka m’bu: n’ihi na ọ bu onye ọ bula M’gēzì gi ka i gējekuru, ọ bu kwa ihe ọ bula M’genye gi n’iwu ka i gēkwu.

8 Atula egwu iru-ha: n’ihi na gi ka M’nọyere inaputa gi, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

9 Jehova we setipu aka-Ya, me ka o rutu ọnum: Jehova we sim, Le, etinyewom okwum nile n’ọnu-gi:

10 le, emewom gi ta ka i lekọta mba nile, lekọta kwa ala-eze nile, iropu, na ikwada, na ime ka ha la n’iyì, na itikpọ, na iwu ulo, na iku ihe.

11 Okwu Jehova we ruem nti, si, Gini ka gi onwe-gi nāhu, Jeremaia? M’we si, Nkpa-n’aka nke osisi almond ka m’nāhu.

12 Jehova we sim, I huwo nke-ọma: n’ihi na onye nāmu anya ka M’bu n’ebe okwum di ime ya.

13 Okwu Jehova we ruem nti nke ub͕ò abua, si, Gini ka gi onwe-gi nāhu? M’we si, Ite afunwuworo ọku n’okpuru ya ka m’nāhu; iru-ya site-kwa-ra n’Ugwu.

14 Jehova we sim, N’Ugwu ka agēsi tọpu ihe ọjọ idakwasi ndi nile bi n’ala nka.

15 N’ihi na, le, M’gaje ikpọ ab͕uru nile nke ala-eze nile nke Ugwu òkù, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta; ha gābia kwa, do, onye ọ bula oche-eze-ya, n’oghere ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem, na imegide mb͕idi-ya nile buruburu, na imegide obodo nile nke Juda.

16 M’gēkwu kwa okwu ikpem nile n’ebe ha nọ bayere ihe ọjọ ha nile; n’ihi na ha arapuwom, we surere chi ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, kpọ kwa isi ala nye ọlu di iche iche nke aka-ha.

17 Ma gi onwe-gi, ke ihe-ọkiké n’úkwù-gi, bilie, gwa ha ihe nile Mu onwem nēnye gi n’iwu: atula ujọ ha, ka M’we ghara ime ka i tu ujọ n’iru ha.

18 Ma Mu onwem, le, ewerewom i nye ta ibu obodo ewusiri ike, na ibu ide ígwè, na ibu mb͕idi ọla, imegide ala nka nile, imegide eze nile nke Juda, imegide ndi-isi-ya, imegide ndi-nchu-àjà-ya, na imegide ndi ala ahu.

19 Ha gēbuso kwa gi agha; ma ha agaghi-enwe ike imegide gi: n’ihi na gi ka M’nọyere, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), inaputa gi.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 2

1 Okwu Jehova we ruem nti, si,

2 Je, kpọ òkù na nti nke Jerusalem, si, Otú a ka Jehova siri, Echetawom n’ebe i nọ ebere nke mb͕e i nọ na nwata, ihu-n’anya nke mb͕e aluru gi ọhu: otú i jesorom n’ọzara, n’ala anāghaghi nkpuru.

3 Israel bu ihe nsọ Jehova nwere, nkpuru mbu nke ihe-ọmume-Ya: ikpe gāma ndi nile nke nēripia ya; ihe ọjọ gābiakwasi ha, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

4 Nurunu okwu Jehova, unu ulo Jekob, na ab͕uru nile nke ulo Israel:

5 otú a ka Jehova siri, Àjọ omume gini ka nna-unu-hà huworo n’arum, na ha esiwo n’ebe M’nọ je n’ebe di anya, we jeso ihe-efu, we ghọ ihe-efu?

6 Ha asighi kwa, Òle ebe Jehova nọ, bú Onye meworo ka ayi si n’ala Ijipt rigoputa; Onye meworo ka ayi je ije n’ọzara, n’ala nke ebe ihe nādighi na nke olùlù, n’ala ọkpọ-nku na nke onyinyo ọnwu, n’ala nke ọ nādighi onye gabigara nime ya, na nke madu nēbighi n’ebe ahu?

7 M’we me ka unu bata n’ala nke ubi ọma, iri nkpuru-ya na ezi ihe-ya: unu we bata, we merua alam, me ka ihe-nketam ghọ ihe-árú.

8 Ndi-nchu-àjà asighi, Òle ebe Jehova nọ? ọzọ, ndi ji iwum eme ihe amaghm: ndi-ọzùzù-aturu jehie-kwa-ra megidem, ndi-amuma ji-kwa-ra Beal bu amuma, ọ bu kwa ihe nādighi-abà urù ka ha jesoro.

9 N’ihi ya Mu na unu gēkpe kwa ikpe ọzọ, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), Mu na umu umu-unu gēkpe kwa ikpe.

10 N’ihi na, gabiganu rue agwe-etiti nile nke Kitim, we hu; ziga-kwa-nu na Kida, we chigharia uche nke-uku; hu-kwa-nu ma ihe di otù a adiwo.

11 Ọ̀ di mba ab͕anweworo chi di iche iche ha, ọ bu ezie na ihe ahu abughi chi? ma ndim ab͕anwewo nsọpuru-ha n’ihe nadighi-abà urù.

12 Ka ibodo ihe a nwu a unu n’aru, unu elu-igwe, tuanu oké ujọ, burunu ihe tọb͕ọrọ n’efu nke-uku, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

13 N’ihi na ihe ọjọ abua ka ndim meworo; Mu ka ha rapuworo, bú isi-iyi nke miri nēnye ndu, ka ha we gwuwara onwe-ha olùlù-miri di iche iche, bú olùlù-miri tipúru etipú, nke nānagideghi miri.

14 Israel, ọ̀ bu orù? ọ̀ bu orù amuru n’ulo ka ọ bu? gini mere o ji ghọ ihe-nluta-n’agha?

15 Ya ka umu-ọdum nāb͕o uja, ha ewewo ka olu-ha da udà: ha we me ka ala-ya ghọ ebe tọbọrọ n’efu; esuresiwo obodo-ya nile oku, ha we ghara inwe onye-obibi.

16 Ọzọ, umu Nof na Tahpanhes nērichapu opu-n’isi-gi.

17 Ọ̀ bughi nka ka i nēmere onwe-gi, n’irapu Jehova, bú Chineke-gi, mb͕e Ọ nēme ka i je ije n’uzọ?

18 Ma ub͕u a gini ka i nwere n’uzọ Ijipt, n’iṅu miri Shaihoa? ma-ọbu gini ka i nwere n’uzọ Asiria, n’iṅu miri nke Osimiri ahu?

19 Ihe ọjọ gi gādọ gi aka na nti, ndaghachi-azu-gi nile gāba-kwa-ra gi nba: ya mere mara, hu na ihe ọjọ na ihe di ilu ka ọ bu, na i rapuworo Jehova, bú Chineke-gi, oké egwum we ghara idi n’aru gi, ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

20 N’ihi na site na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka M’b͕ajiworo yoke-gi, tijie ab͕u-gi nile; i we si, M’gaghi-efè òfùfè; n’ihi na n’elu ugwu ntà ọ bula di elu nan’okpuru osisi ndu ọ bula ka gi onwe-gi nērulata onwe-gi, nākwa iko.

21 Ma Mu onwem kuru gi-ri osisi vine kachasi nma, nkpuru nke bu nání ihe ziri ezi: ì si kwa aṅa b͕anwe orù osisi vine nke ala ọzọ n’ebe M’nọ?

22 N’ihi na ọ buru na i ji akanwu sa aru, i were kwa n’onwe-gi ọtutu nchà, ma akaworo ajọ omume-gi n’irum, ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

23 Ì gēsi aṅa si, Arughm árú, ejesoghm Bealim? le uzọ-gi na ndagwurugwu, mara ihe i meworo: i bu nwa-ab͕ọghọ-camel di nkọ nāb͕aghari n’uzọ-ya nile;

24 i bu nne-inyinya-ibu-ọhia nke mara ọzara aka; n’ọchichọ nke nkpuru-obi-ya o kubawo ifufe; na mb͕e ọbub͕a-ya ònye gēme ka ọ laghachi azu? ndi nile nke nāchọ ya agaghi-ada #mbà; n’ọnwa-ya ka ha gāchọta ya.

25 B͕ochie ukwu-gi n’ibà ukwu efu, b͕ochi kwa akpiri-gi n’ikpọ-nku: ma i siri, Ntukwasi-obi adigh: é-è; n’ihi na ahuwom ndi ala ọzọ n’anya, ha ka m’gējeso kwa.

26 Dika ihere onye-ori mb͕e anāchọputa ya, otú a ka emeworo ka ihere me ulo Israel; ha onwe-ha, na ndi-eze-ha, na ndi-isi-ha, na ndi-nchu-aja-ha, na ndi-amuma-ha;

27 ndi nāsi osisi, Nnam ka i bu; nāsi kwa nkume, Gi onwe-gi murum: n’ihi na ha ab͕akutawom azu, ha echeghm iru: ma na mb͕e ọnọdu ọjọ ha ha gasi, Bilie, we zọputa ayi.

28 Ma òle ebe chi-gi nile nke i meworo nye onwe-gi nọ? ka ha bilie, ọ buru na ha gāzọputa gi na mb͕e ọnọdu ọjọ gi: n’ihi na dika ọnu-ọgugu obodo-gi nile si di, otú a ka chi-gi nile di, Juda.

29 N’ìhi gini ka unu nārusom uka? unu nile ejehiewo megidem, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

30 N’efu ka M’tib͕uworo umu-unu; ọ dighi ọdidọ-aka-na-nti ha natara: mma-agha-unu erichapuwo ndi-amuma-unu, dika ọdum nke nēbibi ebibi.

31 Unu ọb͕ọ a, unu onwe-unu le Jehova. Ọ̀ bu ọzara ka M’buworo Israel? ma-ọ̀bu ala nke oké ọchichiri? gini mere ndim ji si, Ayi lupuru alupu; ayi agaghi-abiakute Gi ọzọ?

32 Nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, ọ̀ gēchezọ ihe-ichọ-nma-ya? nwayi aluru ọchu, ọ̀ gēchozọ ihe ike n’úkwù-ya? ma ndim echezọwom ubọchi nādighi ọnu-ọgugu.

33 Gini mere i ji eme ka uzọ-gi di nma ichọ ihu-n’anya? n’ihi ya ọbuná ndinyom ọjọ ka i zíworo uzọ-gi nile.

34 Ọzọ, n’ọnu-ọnu-uwe-gi ka achọtaworo ọbara nke nkpuru-obi nke ndi-ob͕eye nēmeghi ihe ọjọ: ọ bughi na ntipú-ulo ka i chọtara ha, kama ọ bu n’ihi ihe ndia nile.

35 Ma i siri, Emeghm ihe ọjọ; n’ezie iwe-Ya esiwo n’arum laghachi. Le, Mu na i ganēje n’ikpé, n’ihi na i siri, Emehieghm.

36 Gini mere i ji kpaghari nke-uku ib͕anwe uzọ-gi? ihere Ijipt gēme kwa gi, dika ihere Asiria mere gi.

37 Ọbuná n’ala nka ka i gēsi pua, aka-gi abua adi kwa n’isi-gi: n’ihi na Jehova ajuwo ihe-ntukwasi-obi-gi nile, ọ gaghi-aga-kwa-ra gi nke-ọma nime ha.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 3

1 Ọ si, Le, ọ buru na nwoke achupu nwunye-ya, nwayi ahu ewe si n’ebe ọ nọ la, we ghọ nwunye nke nwoke ọzọ, di mbu ya, ọ̀ gālu kwa ya ọzọ? àgaghi-emeru ala ahu emeru nke-uku? Ma gi onwe-gi akwawo iko, gi na ọtutu ndi-iko: ì si na i gālaghachikutem? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

2 Welie anya-gi abua le ebe nile di elu nke ọhia nādighi, hu; òle ebe gi na ndikom nēdinakọtaghi? N’uzọ nile ka i nọworo nēle anya ha, dika onye Arebia n’ọzara; i we were ikwa-iko-gi nile, were kwa ihe ọjọ gi, merua ala.

3 Ewe b͕ochie oké miri-ozuzo nile, miri-ozuzo ikpe-azu adighi kwa; ma egedege-iru nke nwayi nākwa iko ka i nwere, i juru ka etiye gi n’ọnọdu-ihere.

4 Ì sighi na mb͕e a kpọkuem, si, Nnam, di m’nwere n’ab͕ọghọ ka I bu?

5 Ọ̀ gēchebe iwe-Ya rue mb͕e ebighi-ebi? Ọ̀ gēdebe ya rue ọgwugwu ihe nile? Le, i kwuwo otú a, i we me ihe ọjọ gi nile, we nwe ike.

6 Jehova we sim n’ubọchi Josaia, bú eze, Ì huwo ihe Israel nke nādaghachi azu meworo? nwayi ahu nēje n’elu ugwu ọ bula di elu, na n’okpuru osisi ndu ọ bula, we nākwa iko n’ebe ahu.

7 M’we si, mb͕e ọ mesiri ihe ndia nile, Ya laghachikutem; ma ọ laghachigh: nwa-nne-ya nke nāghọb͕u, bú Juda, we hu ya.

8 M’we hu na, mb͕e M’chupusiri Israel, nye ya akwukwọ nkewa-ya n’ihi ihe ndia nile, bú na Israel nke nādaghachi azu kwarari iko, na nwa-nne-ya nwayi nke nāghọb͕u aghọb͕u, Juda atughi egwu; ọ we je kwa iko, ọbuná ya onwe-ya.

9 O rue, site n’idi-nfe nke ikwa-iko-ya, na emeruru ala-ya, ọ we kwaso nkume, kwaso kwa osisi, iko.

10 Ma ọbuná n’ihe a nile nwa-nne-ya nwayi nke nāghọb͕u, bú Juda, ejighi obi-ya nile laghachikutem, kama o ji okwu-ugha, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

11 Jehova we sim, Israel nke nādaghachi azu egosiwo onwe-ya onye ezi omume kari Juda nke nāghọb͕u aghọb͕u.

12 Je, kpọsa okwu ndia n’uzọ Ugwu, si, Lata, gi Israel nke nādaghachi azu, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta; M’gaghi-edo unu iru iwe: n’ihi na onye-ebere ka M’bu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), M’gaghi-edebe iwe rue mb͕e ebighi-ebi.

13 Nání mara ajọ omume-gi, na ọ bu Jehova, bú Chineke-gi, ka i jehieworo megide, i we wasara ndi ala ọzọ uzọ-gi nile n’okpuru osisi ndu ọ bula, ma olum ka unu nēgeghi nti, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

14 Latanu, umu nke nādaghachi azu, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta; n’ihi na Mu onwem bu di nwe unu: M’gēwere kwa unu, otù site n’otù obodo, abua site n’otù ab͕uru, M’gēme kwa ka unu biarue Zaion:

15 M’gēnye kwa unu ndi-ọzùzù-aturu dika obim si di, ndi gēji ihe-ọmuma na inwe-uche azù unu.

16 O gēru kwa, mb͕e unu baworo uba, mu kwa ọmùmù n’ala-unu, n’ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na ha agaghi-asi ọzọ, Ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova; ọ gaghi-abà kwa n’obi: ha agaghi-echeta kwa ya; ha agaghi-eleta kwa ya; agaghi-eme kwa ya ọzọ.

17 Na mb͕e ahu ka ha gākpọ Jerusalem oche-eze Jehova; agāchikọta kwa mba nile rue ya, inye aha Jehova, rue Jerusalem: ha agaghi-ejeso kwa isi-ike nke obi ọjọ ha.

18 N’ubọchi ahu ulo Juda gējekuru ulo Israel, ha gāyikọ kwa bia site n’ala Ugwu rue ala ahu nke M’mere ka nna-unu-hà keta.

19 Ma Mu onwem siri, M’gēsi aṅa tiye gi n’etiti umu, we nye gi ala anāchọsi ike, ihe-nketa nke mara nma nke usu nile nke mba di iche? M’we si, Nnam ka unu gākpọm; unu agaghi-esi kwa n’isom laghachi azu.

20 N’ezie dika nwayi si ewere nghọb͕u rapu di-ya, otú a ka unu ghọb͕uworom, unu ulo Israel; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

21 Olu ka anuru n’elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi, bú ikwa-ákwá na aririọ-amara nile nke umu Israel; n’ihi na ha emewo ka uzọ-ha gbagọ, ha echezọwo Jehova, bú Chineke-ha.

22 Latanu, umu nke nādaghachi azu, M’gāgwọ ndaghachi-azu nile nke unu. Le ayi anya, ayi abiakutewo Gi; n’ihi na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chineke-ayi.

23 N’ezie n’efu ka nzọputa ahu bu nke anēle anya ya site n’ugwu ntà di iche iche, bú ìgwè madu n’elu ugwu nile: n’ezie na Jehova, bú Chineke-ayi, ka nzọputa Israel di.

24 Ma ihe-ihere ahu erichapuwo ihe putara na ndọb͕u nna-ayi-hà dọb͕uru onwe-ha n’ọlu site na mb͕e ayi di na nwata; ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha, na umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom.

25 Ka ayi dina ala n’ihere-ayi, ka ọnọdu-ihere etiyere ayi nime ya kpuchi kwa ayi: n’ihi na Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi mehieworo megide, ayi onwe-ayi na nna-ayi-hà, site na mb͕e ayi di na nwata we rue ta: ayi egeghi kwa nti n’olu Jehova, bú Chineke-ayi.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 4

1 Ọ buru na i gālata, gi Israel, (ọ bu ihe si nọnu Jehova puta), Mu ka i gālaghachikute: ọ buru kwa na i gēwezuga ihe-árú-gi nile n’irum, i gaghi-awaghari;

2 i gāṅu kwa iyi, Jehova nādi ndu, n’ezi-okwu, na n’ikpé ziri ezi, na n’ezi omume; mba nile gāgọzi kwa onwe-ha nime Ya, ọ bu kwa nime Ya ka ha gānya isi.

3 N’ihi na otú a ka Jehova siri ndikom Juda, si kwa Jerusalem, Lucharanu onwe-unu ubi, unu agha-kwa-la nkpuru n’etiti ogwu.

4 Bìenu onwe-unu úgwù nye Jehova, bìenu onwe-unu úgwù n’obi, unu ndikom Juda na ndi bi na Jerusalem: ka ọnuma m we ghara ipu dika ọku, we re nke ọ nādighi onye nēmenyu, site n’ihe ọjọ nke omume nile unu.

5 Gosinu na Juda, me-kwa-nu ka anuru ya na Jerusalem; si-kwa-nu, Fùanu opì-ike n’ala nka: kpọzuenu nkpu, si, Chikọtanu onwe-unu, ka ayi ba kwa n’obodo nile ewusiri ike.

6 Bulienu ọkọlọtọ n’uzọ Zaion: latanu n’ulo ọsọsọ, unu eguzola: n’ihi na ihe ọjọ ka Mu onwem nēme ka o si n’Ugwu bia, ya na ntipia uku.

7 Ọdum esiwo n’alughi-ulù-ya rigo, bú onye nēbibi mba di iche iche; o buliwo ije-ya, o siwo n’ọnọdu-ya puta; ime ka ala-gi ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu; obodo-gi nile gāghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu, ghara inwe onye-obibi.

8 N’ihi nka kenu ákwà-nkpe n’úkwù-unu, tienu aka n’obi, kwasi kwa ákwá ike: n’ihi na iwe di ọku nke Jehova esighi n’aru ayi laghachi.

9 O gēru kwa n’ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na obi eze gāla n’iyì, ya na obi ndi-isi; ibobo gānwu kwa ndi-nchu-aja n’aru, ọ gāb͕agwoju kwa ndi-amuma anya.

10 M’we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! n’ezie I rafuwo ndi nka na Jerusalem nke-uku, si, Udo gādiri unu, ma mma-agha emetuwo nkpuru-obi aru.

11 Na mb͕e ahu ka agāsi ndi nka, si kwa Jerusalem, Ifufe di ọku, nke sitere n’ebe di elu nke ọhia nādighi ya nke di n’ọzara, nēfe n’uzọ ada ndim, ọ bughi ifucha afucha, ọ bughi kwa ime ka adi ọcha;

12 ifufe nke juru eju nke sitere n’ebe ndia gābiaram: ub͕u a Mu onwem gēkwu kwa ọkwu ikpé nile n’ebe ha nọ.

13 Le, dika igwe-oji ka ọ nārigota, ọ bu kwa dika oké ifufe ka ub͕ọ-ala-ya nile di: inyinya-ya nile di garagara kari ugo. Ahuhu gādiri ayi! n’ihi na ebibiwo ayi.

14 Sapu obi-gi n’ihe ọjọ, gi Jerusalem, ka ewe zọputa gi. Rùe ole mb͕e ka i gēme ka ajọ èchìchè-gi nile nọ ọnọdu-abali n’etiti gi?

15 N’ihi na otù olu nēgosi site na Dan, ọ nēme kwa ka anuru ajọ ihe site n’ugwu Efraim:

16 hotaranu mba nile; le, menu ka anuru ya megide Jerusalem, si, na ndi-nche nābia site n’ala di anya, ha we me ka olu-ha da megide obodo nile nke Juda.

17 Dika ndi nēdebe ubi, otú a ka ha nọ nēmegide ya buruburu; n’ihi na Mu ka ọ nupuworo isi n’okpuru, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

18 Uzọ-gi na omume-gi nile ewewo gi ihe ndia; nka bu ihe ọjọ gi; n’ihi na ọ di ilu, n’ihi na o rutuwo obi-gi aru.

19 Ngiri-afọm, ngiri-afọm! anamab͕ali na mb͕idi nile nke obim; obim nāsu udè nke-uku nimem; adighm-ab͕a nkiti; n’ihi na olu opì-ike ka i nuworo, nkpuru-obim, bú udà-opì agha.

20 Ntipia n’elu ntipia ka anākpọ; n’ihi na ebibiwo ala nka nile: na mberede ka ebibiworo ulo-ikwūm nile, n’otù ntabi-anya ka ebibiworo ákwà-nkwubam nile.

21 Rùe ole mb͕e ka m’gāhu ọkọlọtọ, nu olu opì-ike?

22 N’ihi na ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ ka ndim bu, Mu ka ha nāmaghi; umu di nzuzu ka ha bu, ndi nādighi-aghọta ihe ka ha bu: ndi mara ihe ka ha bu n’ime ihe ọjọ, ma ime ezi ihe ka ha nāmaghi.

23 Ahurum uwa, ma, le, ọ bu ihe tọb͕ọrọ n’efu na ihe tob͕oro nkiti; ahu-kwa-ram elu-igwe, ma ìhè-ha adighi.

24 Ahurum ugwu, ma, le, ha nāma jijiji, ugwu ntà nile me-kwa-ra nkapatu.

25 Ahurum, ma, le, ọ dighi madu di, anu-ufe nile nke elu-igwe efelawo kwa.

26 Ahurum, ma, le, ubi ọma bu ọzara, akwatusi-kwa-ra obodo-ya nile n’iru Jehova, n’iru iwe-Ya di ọku.

27 N’ihi na otú a ka Jehova siri, Ebe tọb͕ọrọ n’efu ka ala nka nile gābu; ma M’gaghi-eme ka ọ gwusia.

28 N’ihi nka ka uwa gēru újú, elu-igwe nke di n’elu gēji kwa nji: n’ihi na ekwubewom, ezubewom, echègharighkwam, M’gaghi-esi kwa nime ya laghachi azu.

29 Site n’olu ndi-inyinya na ndi-ọb͕a-uta obodo a nile nāb͕alaga; ha abawo n’ọhia b͕ara ọchichiri, ọ bu kwa na nkume nile di elu ka ha rigoworo: obodo ọ bula ka arapuworo, ọ dighi kwa onye ọ bula nēbi nime ha.

30 Ma gi onwe-gi, mb͕e ebibiworo gi, gini ka i gēme? Mb͕e i geyi uwe uhie, mb͕e i gēke ihe-ichọ-nma ọla-edo, mb͕e i gēji ihe-ichọ-nma me ka anya-gi abua sa mbara, n’efu ka i nēme onwe-gi ka i ma nma; ndi-iko-gi ajuwo gi, ndu-gi ka ha nāchọ.

31 N’ihi na olu dika nke nwanyi ime nēme ka m’nuworo, ihe-nb͕u dika nwanyi nāmu nwa mbu ya, bú olu nke ada Zaion, o nēku ike ike, ọ nāb͕asa ọbu-aka-ya abua, si, Ahuhu dirim nọ̄! n’ihi na nkpuru-obim nāda #mbà n’iru ndi-ob͕u-madu.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 5

1 Jegharianu n’èzí nile nke Jerusalem, biko, hunu, we mara, chọ-kwa-nu n’amá-ya nile, ma ọ buru na unu gāchọta nwoke ọ bula, ọ buru na ọ di onye nēme ihe ekpere n’ikpé, onye nāchọ ikwesi-ntukwasi-obi; M’gāb͕aghara kwa obodo a.

2 Ma ọ buru na ha asi, Jehova nādi ndu; n’ezie n’okwu-ugha ka ha na-aṅu iyi.

3 Jehova, ànya-Gi abua adighi n’ebe ikwesi-ntukwasi-obi di? I tiwo ha ihe, ma o wutaghi ha; I mewo ka ha gwusia, ma ha ajuwo inara idọ-aka-na-nti: ha emewo ka iru-ha di ike nkume; ha ajuwo ilata.

4 Mu onwem we si, N’ezie ndi nēnweghi ike ka ha bu: ha b͕agọrọ ab͕agọ n’uche-ha; n’ihi na ha amaghi uzọ Jehova, na ikpé nke Chineke-ha:

5 ka M’jekuru ndi uku, gwa ha okwu; n’ihi na ndi ahu mara uzọ Jehova, na ikpé nke Chineke-ha. Ma ndi ahu ab͕ajiwo yoke n’otù, tijie ab͕u nile.

6 N’ihi ya ọdum nke sitere n’oké ọhia gētib͕u ha, anu-ọhia wolf nke ala ihe nādighi gēbibi ha, agu ganēche obodo nile ha anya, agādọb͕u onye ọ bula nke nāpu nime ha: n’ihi na njehie-ha di ọtutu, ndaghachi-azu nile nke ha di kwa ike.

7 M’gēsi kwa aṅa b͕aghara gi? umu-gi arapuwom, we were ihe nābughi chi ṅu iyi: mb͕e M’mere ka ha rijue afọ, ha we kwa iko, ọ kwa n’ulo nwanyi nākwa iko ha nēdo onwe-ha n’usu ndi nāpunara madu ihe.

8 Inyinya azùru azù nke-oma nke nāb͕à nne-inyinya ka ha bu: nwoke ọ bula nime ha nēbeso nwunye madu-ibe-ya.

9 M’gaghi-eleta n’ihi ihe ndia? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta: nkpuru-obim, ọ̀ gaghi-abọ̀ kwa mba nke di otú a ọ́bọ̀?

10 Rigonu n’elu mb͕idi-ya nile, bibie; ma unu emela ka ọ gwusia: wezuganu alaka-ya nile: n’ihi na ọ bughi ihe Jehova nwere ka ha bu.

11 N’ihi na ulo Israel na ulo Juda aghọb͕uwom nke-uku, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

12 Ha agọnariwo Jehova, si, Ọ bughi Ya; ihe ọjọ agaghi-abiakwasi kwa ayi; ayi agaghi-ahu kwa mma-agha na oké unwu:

13 ndi-amuma gāghọ kwa ifufe, okwu-Ya adighi kwa nime ha: otú a ka agēme ha.

14 N’ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, ji si otú a, N’ihi unu nēkwu okwu a, le, anameme okwum nke di n’ọnu-gi ka ha ghọ ọku, anameme kwa ka ndi ghọ nkú, ọ gērichapu kwa ha.

15 Le, anameme ka otù mba si n’ebe di anya biakwasi unu, ulo Israel, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta:) mba di ike ka ọ bu, mba nke sitere na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka ọ bu, ọ bu mba nke i nādighi-ama asusu-ya, nke I nādighi-anu kwa ihe ha nēkwu.

16 Àkpà-àkú-ha di ka ílì ghere oghe, ha nile bu ndi-dike.

17 Ha gērichapu kwa owuwe-ihe-ubi-gi, na nri-gi, nke umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom nēri: ha gērichapu ìgwè ewu na aturu-gi na ìgwè ehi-gi: ha gērichapu osisi vine gi na osisi fig i: ha gēji mma-agha titu obodo-gi nile ewusiri ike, nke gi onwe-gi nātukwasi ha obi.

18 Ma ọbuná n’ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), M’gaghi-eme ka unu gwusia.

19 Ọ gēru kwam mb͕e unu gāsi, N’ìhi gini ka Jehova, bú Chineke-ayi, meworo ayi ihe nile ndia? na i gāsi ha, Dika unu rapurum, we fè chi di iche iche nke ala ọzọ n’ala-unu, otú a ka unu gēfè ndi ala ọzọ n’ala nābughi nke unu.

20 Gosinu nka n’ulo Jekob, me kwa ka anuru ya nime Juda, si,

21 Biko, nurunu nka, unu ndi di nzuzu, nke obi amam-ihe nādighi; anya abua ka ha nwere, ma ha adighi-ahu uzọ; nti abua ka ha nwere, ma ha adighi-anu ihe:

22 ọ̀ bu Mu ka unu nādighi-atu egwum? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta: ọ̀ gaghi-eb͕u unu nb͕u n’ihi irum? Mu onye doworo ájá ibu ókè nke oké osimiri, site n’ukpuru ebighi-ebi, ọ gaghi-agabiga kwa ya, ọ bu ezie na nmali-miri-ya nile nāmaghari, ma ha apughi; ọ bu ezie na ha nēbib͕o, ma ha adighi-agabiga ya.

23 Ma ndi nka nwere obi nēwezuga onwe-ya nānupu kwa isi; ha ewezugawo onwe-ha, we la.

24 Ha asighi kwa n’obi-ha, Biko, ka ayi tua egwu Jehova, bú Chineke-ayi, Onye nēnye oké miri-ozuzo, ma nke-mbu ma nke-ikpe-azu, na mb͕e-ya; ízù nile akara àkà nke owuwe-ihe-ubi ka Ọ nēdebere ayi.

25 Ajọ omume nile unu ewezugawo ihe ndia, nmehie nile unu eb͕ochiwo-kwa-ra unu ezi ihe.

26 N’ihi na ahuwo ndi nēmebi iwu n’etiti ndim: ha nēle anya buruburu, dika ndi-osi-ọnyà si eche anwu; ha esiwo ọnyà, ọ bu madu ka ha nānwude.

27 Dika nkata nnunu si ejuputa n’anu-ufe, otú a ka ulo nile ha juputara n’aghughọ: n’ihi nka ka ha ghọworo ndi uku, we buru ọgaranya.

28 Ha amawo abuba, aru-ha eb͕uwo àmùmà: e, emebigawo ihe ọjọ ókè: ha ekpeghi ọnu, bú ọnu nke nwa-nb͕ei, ka o we gara ha nke-ọma; ọ bu kwa ikpe nke ndi-ob͕eye ka ha nādighi-ekpe.

29 M’gaghi-eleta n’ihi ihe ndia? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta: nkpuru-obim, ọ̀ gaghi-abọ̀ kwa mba nke di otú a ọ́bọ̀?

30 Ihe-iju-anya na ihe jọb͕uru onwe-ya emewo n’ala;

31 ndi-amuma ebuwo amuma ugha, ndi-nchu-àjà nāzọda kwa ndim site n’aka-ha; ndim ahuwo kwa ihe di otú a n’anya: ma gini ka unu gēme n’ikpe-azu-ya?