Categories
ILU

ILU 23

1 Mb͕e i soro onye nāchi achi iri nri,

Ghọta nke-ọma onye ahu nke nọ n’iru gi;

2 Tukwasi kwa mma n’akpiri-gi,

Ma ọ buru na onye nri-ya nātọ ya utọ ka i bu.

3 Achọsila nri utọ ya ike;

Ebe nri ahu bu nri okwu-ugha.

4 Adọb͕ula onwe-gi n’ọlu ibu ọgaranya;

Site na nghọta-gi ra ya aka.

5 Ì gātukwasi anya-gi abua na ya? ọ dighi kwa:

N’ihi na àkù nēmere onwe-ya nkù n’ezie, Dika ugo ka ọ nēfesi n’elu-igwe.

6 Erila nri nke onye nwere anya ọjọ,

Achọsi-kwa-la nri utọ ya ike:

7 N’ihi na dika o si echè èchìchè na nkpuru-obi-ya, otú a ka ọ di:

Rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ka ọ nāsi gi; Ma obi-ya adighi n’ebe i nọ.

8 Iberibe-nri-gi nke i riworo ka i gāb͕ọputa,

Okwu-gi nile nke di utọ ewe funari gi.

9 Ekwula okwu na nti onye-nzuzu;

N’ihi na ọ gēleda ezi uche nke okwu-gi nile anya.

10 Ewezugala ókè-ala nke diworo mb͕e ebighi-ebi;

Abà-kwa-la n’ọhia ọ bula nke umu-nb͕ei:

11 N’ihi na Onye-nb͕aputa-ha di ike;

Ya onwe-ya gēkpe ọnu-ha megide gi.

12 Me ka obi-gi ba n’idọ-aka-na-nti,

Me kwa ka nti-gi abua ba n’okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma.

13 Eb͕ochila idọ-aka-na-nti n’aru nwata:

Mb͕e i gēji nkpa-n’aka tie ya, ọ gaghi-anwu.

14 Gi onwe-gi gēji nkpa-n’aka tie ya,

We naputa nkpuru-obi-ya n’ala-mọ.

15 Nwam, ọ buru na obi-gi mara ihe,

Obim gāṅuri, ọbuná nkem:

16 Akurum abua gāwuli kwa n’ọṅù,

Mb͕e eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua nēkwu ihe ziri ezi.

17 Ekwela ka obi-gi kwoso ndi-nmehie ekworo:

Kama n’egwu Jehova ka i gānọ ogologo ubọchi nile.

18 N’ihi na ọdi-n’iru aghaghi idi;

Agaghi-ebipu kwa olile-anya-gi.

19 Nuru, gi onwe-gi, nwam, we mara ihe,

Me kwa ka obi-gi gazi agazi n’uzọ.

20 Anọla n’etiti ndi nāṅubiga manya-vine ókè;

N’etiti ndi nēribiga anu ókè:

21 N’ihi na onye nāṅubiga manya ókè na onye nēribiga ihe ókè ka agānapu ihe nile:

Ọ bu kwa nkirika ákwà ka òrù-ura gēyikwasi madu.

22 Ge nna-gi, bú onye muru gi, nti,

Eleda-kwa-la nne-gi anya mb͕e o mere agadi.

23 Zuta ezi-okwu, ere-kwa-la ya;

E, amam-ihe, na idọ-aka-na-nti, na nghọta.

24 Nna nke onye ezi omume gēteghari egwú ọṅù nke-uku:

Onye nāmu kwa onye mara ihe gāṅuri ọṅu na ya.

25 Ka nna-gi na nne-gi ṅuria,

Ka nwanyi muworo gi teghari kwa egwú ọṅù.

26 Nwam, nyem obi-gi,

Ka uzọm nile tọ kwa anya-gi abua utọ.

27 N’ihi na ọbù nke miri emi ka nwanyi nke nākwa iko bu;

Olùlù nke di nkpà ka nwanyi nābughi nwunye-gi bu.

28 E, nwanyi ahu nēche anwu dika onye nāpunara madu ihe,

Ọzọ, ndi-nghọb͕u n’etiti madu ka ọ nēme ka ha ba uba kari.

29 Ònye nwere ahuhu? ònye nwere iru-újú? ònye nwere ise-okwu?

Ònye nwere ntamu? ònye nwere ob͕ub͕u-mma n’efu?

Ònye nwere anya nācha ọbara-ọbara?

30 Ọ bu ndi nānọ na manya-vine ogologo mb͕e;

Ndi nābà n’ulo ichọputa manya agwara agwa.

31 Elekwasila manya-vine anya mb͕e ọ nācha ọbara-ọbara,

Mb͕e ọ nēnye udi-ya n’iko,

Mb͕e ọ nāsughari n’iko nke-ọma:

32 N’ikpe-azu-ya ọ bu dika agwọ ka ọ nāta,

Ọ bu kwa dika aju-ala ka ọ nātu.

33 Anya-gi abua gāhu ndinyom nābughi nwunye-gi,

Obi-gi gēkwu kwa okwu ib͕akuta Chineke azu.

34 I gādi kwa ka onye nēdina n’etiti oké osimiri,

Ma-ọbu dika onye nēdina n’elu akpu-ub͕ọ.

35 Ha etib͕uwom, ka i gāsi, ariaghm ọria;

Ha apiawom ihe, amaghm:

Òle mb͕e m’gēteta? m’gāchọ kwa ya ọzọ.

Categories
ILU

ILU 24

1 Ekwosola ndi ọjọ ekworo,

Achọsi-kwa-la ike inọ n’etiti ha:

2 N’ihi na ipunara-madu-ihe ka obi-ha nātughari,

Okwu nmeb͕u ka eb͕ub͕ere-ọnu-ha nēkwu.

3 Amam-ihe ka eji ewu ulo;

Ọ bu kwa nghọta ka eji eme ka o guzosie ike:

4 Site kwa n’ihe-ọmuma ka ime-ulo-ya nile nējuputa

N’àkù nile di oké ọnu-ahia di kwa utọ.

5 Onye mara ihe di ike;

E, onye nwere ihe-ọmuma nēme ka ike nwe ume.

6 N’ihi na ezi ndum-ọdu ka i gēji eburu onwe-gi agha:

Ọzọ, nzọputa di n’ọtutu ndi nādu ọdu.

7 Amam-ihe adikara onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ elu:

Ọ dighi-asaghe ọnu-ya n’ọnu-uzọ-ama.

8 Onye nēchè ime ihe ọjọ,

Ya ka agākpọ onye-nwe nzube ọjọ nile.

9 Nzube nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ bu nmehie:

Ọzọ, ihe-árú n’anya madu ka onye nke nākwa emò bu.

10 Ọ buru na i di ume-ngwu n’ubọchi ahuhu,

Ike-gi pere npe.

11 Naputa ndi anāchigara ọnwu,

Ndi ahu kwa anēwezuga n’ọnọdu-ha nye n’ob͕ub͕u, gi lezie anya ka i b͕ochie ha.

12 Mb͕e i si, Le, ayi amaghi ihe a:

Onye nātùzi obi nile, Ònye ahu adighi-aghọta?

Onye nēche kwa nkpuru-obi-gi nche, Ònye ahu adighi-ama?

Ọ̀ gaghi-enyeghachi kwa madu dika ọlu-ya si di?

13 Nwam, racha manu-aṅu, n’ihi na ọ di nma;

Ya na manu-aṅu nke si n’ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nābusi, nke nātọ okpo-ọnu-gi utọ:

14 Mara na otù a ka amam-ihe diri nkpuru-obi-gi:

Ọ buru na i chọtawo ya, ọdi-n’iru gādi kwa, Agaghi-ebipu kwa olile-anya-gi.

15 Gi onye nēmebi iwu, echela anwu imegide ebe-obibi onye ezi omume;

Apunarala ya ebe-izu-ike-ya:

16 N’ihi na ub͕ò asa ka onye ezi omume nāda, bili kwa ọzọ:

Ma ndi nēmebi iwu nāsu ngọngọ n’ihe ọjọ.

17 Aṅurila mb͕e onye-iro-gi nāda,

Ka obi-gi ghara kwa iteghari egwú ọṅù mb͕e ọ nāsu ngọngọ:

18 Ka Jehova we ghara ihu ya, o we jọ njọ n’anya-Ya,

O we me ka iwe-Ya si n’aru ya laghachi.

19 Emela ka iwe-gi di ọku n’ihi ndi nēme ihe ọjọ;

Ekwosola ndi nēmebi iwu ekworo.

20 N’ihi na ọdi-n’iru agaghi-adiri onye ọjọ;

Oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.

21 Nwam, tua egwu Jehova na eze:

Agwakọtala onwe-gi na ndi nēnwo enwo:

22 N’ihi na ọ bu na mberede ka nhuju-anya-ha gēbili;

Ọdida nke ha abua kwa, ònye mara ya?

23 Ndia bu kwa okwu nke ndi mara ihe.

Imata iru madu n’ikpé adighi nma.

24 Onye nāsi onye nēmebi iwu, Onye ezi omume ka i bu;

Ndi nile di iche iche gākpọlu ya, mba nile gēwesa ya iwe:

25 Ma ndi nābara ya nba ka ọ gādi utọ,

Ọ bu kwa ndi ahu ka ezi ngọzi gābiakwasi.

26 O ji eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua esutu ọnu,

Bú onye nāza okwu ziri ezi.

27 Dozie ije-ozi-gi n’èzí,

Jikere-kwa-ra ya onwe-gi n’ọhia;

Emesia wu kwa ulo-gi.

28 Abula onye-àmà megide madu-ibe-gi n’efu;

Ì gēji kwa eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua rafu?

29 Asila, Dika o siri mem, otú a ka m’gēme ya;

M’gēnyeghachi onye ahu dika ọlu-ya si di.

30 N’akuku ubi onye-ume-ngwu ka m’gabigara,

Na n’akuku ubi-vine nke madu obi amam-ihe kọrọ;

31 Ma, le, o púchiri n’ogwu,

Akuba kpuchiri iru-ya,

Akwada-kwa-ra mb͕idi nkume ya.

32 Mu onwem we hu, m’we tukwasi obim na ya:

Ahurum ya, we nata idọ-aka-na-nti.

33 Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà,

Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala:

34 Ob͕eye-gi ewe bia dika onye nējeghari ipunara madu ihe;

Ihe-ukọ-gi kwa, dika nwoke ji ọta.

Categories
ILU

ILU 25

1 Ndia bu kwa ilu Solomon turu, nke ndi Hezekaia, bú eze Juda, deputara n’akwukwọ.

2 Ọ bu nsọpuru Chineke izobe okwu:

Ma nsọpuru ndi-eze bu igwuputa ala okwu.

3 Elu-igwe n’idi-elu-ya, na ala n’omimi-ya,

Na obi ndi-eze, ọ dighi ngwuputa di ha.

4 Wepu afuru-uzu n’ọla-ọcha,

Ihe ewe putara onye nānucha ọla:

5 Wepu onye nēmebi iwu n’iru eze,

Oche-eze-ya ewe guzosie ike n’ezi omume.

6 Asọpurula onwe-gi n’iru eze,

Eguzo-kwa-la n’ọnọdu ndi uku:

7 N’ihi na ọ di nma ka asi gi, Rigota ebe a;

Kari ka eme ka i di ala n’iru onye amara aha-ya,

Onye anya-gi abua huworo.

8 Apula ngwa ngwa ise okwu,

Ka o we ghara ibu na i maghi ihe i gēme n’ikpe-azu-ya,

Mb͕e madu-ibe-gi etiyewo gi n’ọnọdu-ihere.

9 Gi na madu-ibe-gi kwurita okwu-ikpe-gi,

Ekpughe-kwa-la izù nzuzo nke onye ọzọ:

10 Ka onye nke nānu ya we ghara ikwulu gi,

Akukọ ihe ọjọ gi ewe ghara isi n’ebe i nọ laghachi.

11 Nkpuru-osisi apple ọla-edo nime nkata ọla-ọcha

Ka okwu ekwuru na mb͕e kwesiri ya bu.

12 Nb͕a-aka ọla-edo na ihe-ichọ-nma nke ọla-edo ọma

Ka onye nāba nba nke mara ihe bu na nti nke nānu ihe.

13 Dika oyi snow n’ubọchi owuwe-ihe-ubi,

Otú a ka ukọ̀ nke kwesiri ntukwasi-obi diri ndi nēziga ya;

Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-nwe-ya ka ọ nēwelata.

14 Igwe-oji na ifufe nke miri-ozuzo nādighi

Ka onye nke nānya isi n’onyinye okwu-ugha bu.

15 Site n’eweghi iwe ọsọsọ ka anāràye onye-isi,

Ire nrò nānyaji kwa ọkpukpu.

16 Ọ̀ bu manu-aṅu ka i chọtaworo? racha nke gēzuru gi;

Ka i we ghara iriju ya afọ, we b͕ọ ya.

17 Me ka ukwu-gi kọ ukọ n’ulo madu-ibe-gi;

Ka ihe-gi we ghara iju ya afọ, o we kpọ gi asì.

18 Otùtù-agha na mma-agha na àkú di nkọ

Ka onye nke nāb͕a àmà okwu-ugha megide madu-ibe-ya bu.

19 Ezé nyajiri anyaji na ukwu chikwa-puru echikwapu

Ka itukwasi onye-nghọb͕u obi n’ubọchi ahuhu bu.

20 Dika onye nēyipu uwe n’ubọchi oyi, dika manya b͕ara uka n’elu akanwu,

Otú a ka onye nābùru obi jọrọ njọ abù di.

21 Ọ buru na agu nāgu onye nākpọ gi asì, gi me ka o rie nri;

Ọ buru kwa na akpiri nākpọ ya nku, gi me ka ọ ṅua miri:

22 N’ihi na icheku nēre ọku ka i nāgukwasi n’isi-ya,

Jehova gākwughachi kwa gi.

23 Ifufe Ugwu nāmuputa oké miri-ozuzo:

Ọ bu kwa iru oké iwe ka iré nēkwu okwu-azu nāmuputa.

24 Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo,

Kari inọyere nwayi nēse okwu n’ulo bùru ibù.

25 Dika miri oyi si adiri nkpuru-obi nāda #mbà,

Otú a ka okwu ọma anuru site n’ala di anya di.

26 Isi-iyi azọtọrọ azọtọ na ebe-nsuputa-miri bibiri ebibi

Ka onye ezi omume nke anēwezuga n’ọnọdu-ya n’iru onye nēmebi iwu bu.

27 Iracha manu-aṅu ri nne adighi nma:

Otú a ọ buru na madu egwuputa ala nsọpuru-ha ọ bughi nsọpuru.

28 Obodo etikpọrọ etikpọ nke mb͕idi nādighi

Ka onye ọ bula nke nādighi-ebọchi mọ-ya bu.

Categories
ILU

ILU 26

1 Dika snow na mb͕e okpom-ọku, na dika miri-ozuzo na mb͕e owuwe-ihe-ubi,

Otú a nsọpuru amaghi nma nye onye-nzuzu.

2 Dika nnunu na nfeghari-ya, dika eleke n’ofufe-ya,

Otú a nkọcha adighi-abia n’efu.

3 Utari diri inyinya, bridle diri inyinya-ibu,

Nkpa-n’aka di-kwa-ra azu ndi-nzuzu.

4 Azala onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di,

Ka i we ghara idi ka ya, ọbuná gi onwe-gi.

5 Za onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di,

Ka o we ghara ibu onye mara ihe n’anya-ya.

6 Onye nēbipu ukwu onwe-ya na onye nāṅu ime-ihe-ike dika miri

Ka onye ahu bu nēzi ozi site n’aka onye-nzuzu.

7 Ogwe-ukwu abua nke onye-ngwurọ nākwu efe:

Otú a ka ilu di n’ọnu ndi-nzuzu.

8 Dika akpa nkume di iche iche nke di oké ọnu-ahia n’obo nkume,

Otú a ka onye nēnye onye-nzuzu nsọpuru di.

9 Dika ogwu nke dumiworo n’aka onye nāṅubiga manya ókè,

Otú a ka ilu n’ọnu ndi-nzuzu di.

10 Onye-ọ̀kà nākpu ihe nile,

Ma onye nēgo onye-nzuzu ilu ọlu di ka onye nēgo ndi nāgabiga agabiga.

11 Dika nkita nke chighariworo ọzọ n’ihe ọ b͕ọrọ,

Otú a ka onye-nzuzu di nke nēme kwa ihe uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ọzọ.

12 Ì huwo onye ọ bula nke bu onye mara ihe n’anya-ya?

Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu.

13 Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n’uzọ;

Ọdum di n’amá.

14 Dika ibo-ọnu-uzọ si emeghari n’ihe-nkoye-ya,

Otú a ka onye-ume-ngwu nēmeghari n’ihe-ndina-ya.

15 Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n’ọkwa;

Ọ nāgwu ya ike iweghachi ya n’ọnu-ya.

16 Onye-ume-ngwu bu onye mara ihe n’anya-ya

Kari madu asa ndi nāzaghachi okwu n’ezi uche.

17 Onye nējide nkita na nti ka ọ bu,

Bú onye nāgabiga, nēwebiga iwe ókè n’ihi ise-okwu nābughi nke ya.

18 Dika onye-ará nke nātu àkú nēre ọku,

Na àkú, na ọnwu;

19 Otú a ka onye ahu di nke ghọb͕uworo madu-ibe-ya,

We si, Ọ̀ bughi egwú ka m’nēgwu?

20 Mb͕e nkú nādighi ọku gānyu:

Otú a mb͕e ọ dighi onye nēkwu okwu-azu, ise-okwu gādaju.

21 Dika icheku si di n’ebe icheku nēre ọku di, na dika nkú si di n’ebe ọku di;

Otú a ka onye nēse okwu di ime ka ilu-ọ̀gù nwuru ọku.

22 Okwu nile nke onye nēkwu okwu-azu di ka iberibe-nri di iche iche nātọ utọ nke-uku,

Okwu ahu aridawo kwa n’ime-ime-ala afọ.

23 Ejùjù nke amachitaworo n’afuru-uzu ọla-ọcha

Ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēre ọku na obi ọjọ bu.

24 Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka onye nke nākpọ asì nēji buru onye-iru-abua,

Ma nime onwe-ya ka ọ nētiye aghughọ:

25 Mb͕e olu-ya nēkwu amara, ekwela ya;

N’ihi na ihe-árú asa di n’obi-ya.

26 Ọ bu ezie na ikpọ-asi-ya ji nrafu ekpuchi onwe-ya,

Ma agēkpughe ihe ọjọ ya nime nkpọkọta ndi-ya.

27 Onye nēgwu olùlù, nime ya ka ọ gādabà:

Ọzọ, onye nākpọre nkume, ya ka ọ gālaghachikuru.

28 Ire okwu-ugha nākpọ ndi o gwepiaworo asì;

Ọzọ, ọnu nke nēkwu ire-utọ nākpata nnuda.

Categories
ILU

ILU 27

1 Anyala isi bayere echi;

N’ihi na i maghi ihe chi gābọ.

2 Ka onye ala ọzọ to gi, ma ọ bughi ọnu-gi;

Ka onye mba ọzọ to gi, ma ekwela ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua to gi.

3 Nkume di arọ́, ájá bu kwa ibú;

Ma nkpasu-iwe nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ di arọ́ kari ha abua.

4 Ihe nēnweghi obi-ebere ka ọnuma bu, iju-miri ka iwe bu kwa;

Ma ònye gēguzo n’iru ekworo?

5 Ọ di nma, bú iba-nba n’ìhè,

Kari ihu-n’anya nke ezobeworo ezobe.

6 Ihe kwesiri ntukwasi-obi ka ob͕ub͕u-mma nile nke onye nāhu gi n’anya bu:

Ma ihe riri nne ka nsutu-ọnu nke onye nākpọ gi asì bu.

7 Nkupuru-obi nke rijuworo afọ nāzọda manu-aṅu nke si n’ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nābusi:

Ma ihe nile ọ bula nke nēlu ilu nātọ nkpuru-obi agu nāgu utọ.

8 Dika nnunu nke nēsi n’akwu-ya efefu,

Otú a ka madu di nke nēsi n’ọnọdu-ya akpafu.

9 Manu na ihe-nsure-ọku nke nēsi ísì utọ nēme ka obi ṅuria:

Otú a ka utọ eyì madu di nke sitere na ndum-ọdu nke nkpuru-obi.

10 Arapula eyì-gi na eyì nna-gi;

Abà-kwa-la n’ulo nwa-nne-gi n’ubọchi nhuju-anya-gi:

Ọ di nma, bú ab͕ata-obi nke nọ nso, Kari nwa-nne nke nọ n’ebe di anya.

11 Mara ihe, nwam, we me ka obim ṅuria,

Ka m’we zaghachi onye nātam uta okwu.

12 Onye nwere ezi uche ahuwo ihe ọjọ, we zobe onwe-ya:

Ma ndi nēnweghi uche agabigawo, ewe rie ha nra.

13 Chiri uwe-ya, bú onye nọworo onye ala ọzọ na mbe;

N’ọnọdu nwanyi nābughi nwunye-ya nara ya onwe-ya n’ihe-ibe.

14 Onye ji oké olu agọzi madu-ibe-ya, nke nēbili n’isi-ututu ime ya,

Nkọcha ka agāgu ngọzi ahu nye ya.

15 Miri-ọtutu nke nātu mb͕e nile n’ubọchi oké miri-ozuzo,

Ya na nwanyi nke nēse okwu yiri:

16 Onye nēzobe ya ezobewo ifufe,

Ọ bu kwa manu ka aka-nri-ya nēzute.

17 Ígwè nāmucha ígwè;

Otú a ka madu nāmucha iru eyì-ya.

18 Onye nēche osisi fig gēri nkpuru-ya;

Ọ bu kwa onye nāriba onye-nwe-ya ama ka agāsọpuru.

19 Dika miri si eme ka iru hu iru,

Otú a ka obi nēme ka madu hu madu.

20 Afọ adighi-eju ala-mọ na ebe-ila-n’iyì;

Otú a afọ adighi-eju anya abua nke madu.

21 Ite eji anucha ihe diri ọla-ọcha, oké ọku di-kwa-ra ọla-edo,

Anānwa kwa onye ọ bula site n’otuto-ya.

22 Ọ buru na i ji aka-íkwè supia onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ n’íkwè n’etiti ọka asuru asu,

Uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ agaghi-esi n’aru ya wezuga onwe-ya.

23 Mara iru igwè ewu na aturu-gi nke-ọma,

Tukwasi obi-gi n’igwè anu-ulo-gi nile:

24 N’ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka àkù di;

Okpu-eze kwa, ọ̀ nādiru ọb͕ọ nile?

25 Ekpopuwo ahihia, ewe hu ahihia ndu,

Chikọta kwa ihe-ọkukú nile nke ugwu nile.

26 Umu-aturu diri uwe-oyiyi-gi,

Ọnu-ahia nke ọhia-gi ka ewu bu kwa:

27 Ara ewu gēzu-kwa-ra nri-gi, zu-kwa-ra nri ulo-gi;

Buru kwa ihe gēdebe umu-ab͕ọghọ-gi ndu.

Categories
ILU

ILU 28

1 Ndi nēmebi iwu ab͕alagawo mb͕e ọ dighi onye nāchu ha:

Ma ndi ezi omume nwere ntukwasi-obi dika ọdum.

2 N’ihi njehie nke ala ha di ọtutu, bú ndi-isi-ya:

Ma site na madu nwere nghọta na ihe-ọmuma ka ọnọdu-ya gādigide ogologo mb͕e.

3 Nwoke bu ob͕eye nke nēmeb͕u ndi nēnweghi ike,

Ọ di ka miri-ozuzo nke nāzachapu ihe, nri we ghara idi.

4 Ndi nārapu iwu nēto onye nēmebi iwu,

Ma ndi nēdebe iwu nāluso ha ọ̀gù.

5 Ndi ọjọ adighi-aghọta ikpé:

Ma ndi nāchọ Jehova nāghọta ihe nile.

6 Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n’izu-okè-ya,

Kari onye b͕agọrọ ab͕agọ n’uzọ-ya abua, ọ bu ezie na onye ahu bu ọgaranya.

7 Onye nēdebe iwu bu nwa nāghọta ihe:

Ma onye bu eyì ndi nēribiga ihe ókè nētiye nna-ya n’onọdu-ihere.

8 Onye nēme ka àkù-ya ba uba site n’inara uma na ọmuru-nwa,

Ọ nēkpokọta ya nye onye nēmere ndi nēnweghi ike amara.

9 Onye nēwezuga nti-ya n’inu iwu,

Ọbuná ekpere-ya bu ihe-árú.

10 Onye nēme ka ndi ziri ezi waghari n’uzọ ọjọ,

N’olùlù nke aka ya ka ya onwe-ya gādabà:

Ma ndi zuru okè gēketa ezi ihe.

11 Onye mara ihe n’anya-ya ka ọgaranya bu;

Ma onye nēnweghi ike nke nāghọta ihe nēgwuputa ala-ya.

12 Mb͕e obi ndi ezi omume nātọ ha utọ, ọtutu ima-nma di:

Ma mb͕e ndi nēmebi iwu nēbili, agāchọ madu achọ.

13 Onye nēkpuchi njehie-ya nile, ọ gaghi-agara ya:

Ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n’aru ya.

14 Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nātu oké egwu mb͕e nile:

Ma onye nēme ka obi-ya sie ike gādabà n’ihe ọjọ.

15 Ọdum nke nāb͕o uja na anu-ọhia bear nke nāb͕aghari

Ka onye nēmebi iwu nke nāchi ndi nēnweghi ike bu.

16 Gi onye-ndú nke nghọta kọrọ, nke bu kwa onye-nmeb͕u uku,

Onye nākpọ urù nēzighi ezi asì gēme ka ubọchi-ya nile di ogologo.

17 Madu nke ọbara madu nānyib͕u,

Rue olùlù ka ọ gāb͕alaga; ka onye ọ bula ghara ijide ya.

18 Onye nēje ije n’izu-okè ka agāzọputa:

Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n’uzọ abua gāda ngwa ngwa.

19 Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri:

Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, afọ gēju ya n’ibu-ob͕eye.

20 Onye ọ bula nke kwesiri ntukwasi-obi gēnwe ọtutu ngọzi:

Ma onye nānukpọ onwe-ya ibu ọgaranya, agaghi-agu ya n’onye nēmeghi ihe ọjọ.

21 Imata iru madu n’ikpé adighi nma:

Ọ dighi kwa nma ka madu ji n’ihi iberibe nri nējehie.

22 Onye nāb͕aso àkù ka onye nwere anya ọjọ bu,

Ma ọ maghi na ihe-ukọ gābiakute ya.

23 Onye nābara madu nba gēmesia huta amara

Kari onye nēkwu ire-utọ.

24 Onye nānapu nna-ya ma-ọbu nne-ya ihe n’ike, si, Ọ dighi njehie ọ bu;

Onye ejikọtaworo ya na onye-nbibi ka ọ bu.

25 Onye nkpuru-obi-ya di nganga nākpali ise-okwu:

Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme, ya ka ọ ma abuba.

26 Onye nātukwasi obi n’obi nke aka ya, onye ahu bu onye-nzuzu:

Ma onye nēje ije n’amam-ihe, onye ahu ka agēme ka o wepuga onwe-ya.

27 Onye nēnye ob͕eye ihe, ihe adighi-akọ ya:

Ma onye nēzobe anya-ya abua, agābu ya ọtutu ọnu.

28 Mb͕e ndi nēmebi iwu nēbili, madu ezobe onwe-ya:

Ma mb͕e ha nāla n’iyì, ndi ezi omume aba uba.

Categories
ILU

ILU 29

1 Onye anābara nba ọtutu mb͕e ma ọ nēkwesi olu-ya ike,

N’otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.

2 Mb͕e ndi ezi omume nāba uba kari, ndi ala-ha nāṅuri:

Ma mb͕e onye nēmebi iwu nāchi achi, ndi ala-ya nēze ume.

3 Onye ọ bula nke nāhu amam-ihe n’anya nēme ka nna-ya ṅuria:

Ma onye bu eyì nke ndinyom nākwa iko nāla àkù-ya n’iyì.

4 Eze nēji ikpé ziri ezi eme ka ala-ya guzo:

Ma onye nānara onyinye nākwada ya.

5 Nwoke nke nāgwa madu-ibe-ya okwu ire-utọ

Nāb͕asara nzọ-ukwu-ya nile ub͕u.

6 Na njehie onye ọjọ ka ọnyà di:

Ma onye ezi omume nēti nkpu ọṅù nāṅuri kwa.

7 Onye ezi omume nāmata okwu-ikpe nke ndi nēnweghi ike:

Onye nēmebi iwu adighi-aghọta ihe-ọmuma.

8 Ndi nākwa emò nāfuye ọku n’obodo:

Ma ndi mara ihe nēme ka iwe laghachi azu.

9 Ọ buru na onye mara ihe esoro onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ kpe ikpe,

Ma o nwere ọnuma ma ọ chìri ọchì, izu-ike adighi kwa.

10 Ndi-ọbara nākpọ onye zuru okè asì:

Ma ndi ziri ezi nāchọ ọdi-nma nkpuru-obi-ya.

11 Mọ nile nke onwe-ya ka onye-nzuzu nēme ka ọ puta ìhè:

Ma onye mara ihe nēb͕ochi mọ-ya, nēme kwa ka ọ dajua.

12 Ọ buru na onye nāchi achi aṅa nti okwu-ugha,

Ndi nile nējere ya ozi bu ndi nēmebi iwu.

13 Ob͕eye na onye-nmeb͕u ezutewo:

Onye nēnye anya ha abua ìhè bu Jehova.

14 Eze nke nēkpe ndi nēnweghi ike ikpe n’ikwesi-ntukwasi-obi,

Oche-eze-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.

15 Nkpa-n’aka na iba-nba nēnye amam-ihe:

Ma nwata nke anārapu n’onwe-ya nēme ka ihere me nne-ya.

16 Mb͕e ndi nēmebi iwu nāba uba kari, njehie nāba kwa uba kari:

Ma ndi ezi omume gēlekwasi ọdida-ha.

17 Dọ nwa-gi aka na nti, ọ gēme kwa ka i zu ike;

E, ọ gēnye nkpuru-obi-gi ihe-utọ.

18 Mb͕e ọhù nādighi, ndi ala ahu adighi nchikọta:

Ma onye nēdebe iwu, ihe nāgara onye ahu nke-ọma.

19 Ọ bughi okwu agēji dọ orù aka na nti:

N’ihi na ọ bu ezie na ọ nāghọta, ma ọ̀ dighi ihe ọ nāza.

20 Ì huwo onye ọ bula nānukpọ onwe-ya n’okwu-ya nile?

Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu.

21 Onye zutọworo orù-ya site na nwata,

N’ikpe-azu-ya orù ahu gāghọ kwa nwa.

22 Onye-iwe nākpali ise-okwu,

Ọzọ, onye nēnwe ọnuma ri nne nējehie ri nne.

23 Npako madu gēme ka ọ di ala:

Ma onye mọ-ya di ala nējidesi nsọpuru ike.

24 Onye ya na onye-ori nēkekọ ihe nākpọ nkpuru-obi ya onwe-ya asì:

Ọb͕ub͕a-iyi ka ọ nānu, ma ọ dighi-egosi ihe ọ bula.

25 Egwu madu nēweta ọnyà:

Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme ka ọ nọ n’elu.

26 Ọtutu madu nāchọ iru onye nāchi achi:

Ma n’aka Jehova ka ikpé onye ọ bula nēsi bia.

27 Ihe-árú n’anya ndi ezi omume ka onye ajọ omume bu:

Ọzọ, ihe-árú n’anya onye nēmebi iwu ka onye ziri ezi n’uzọ-ya bu.

Categories
ILU

ILU 30

1 Okwu Agua nwa Jake; ibu eboro ya.

Ihe nke si n’ọnu nwoke ahu putara Itiel, ọbuná Itiel na Ukal.

2 N’ezie anu-ọhia ka m’bu kari onye ọ bula,

Ọ dighi kwa nghọta madu m’nwere

3 Amutaghkwam amam-ihe,

Ọ dighi kwa ihe-ọmuma Onye Nsọ m’mara.

4 Ònye rigoworo n’elu-igwe, we rida?

Ònye chikọtaworo ifufe nime nkwukwuba-aka-Ya abua?

Ònye kegideworo miri n’uwe-Ya?

Ònye meworo ka nsọtu nile nke uwa guzosie ike?

Gini bu aha-Ya, gini bu kwa aha nwa-Ya, ma asi na i mara?

5 Okwu-ọnu ọ bula nke Chineke bu ihe anuchaworo:

Ọta ka Ọ buru ndi nāb͕abà nime Ya.

6 Atukwasila ihe n’okwu-Ya nile,

Ka O we ghara ibara gi nba, i we ghọ onye-okwu-ugha.

7 Ihe abua ka m’riọworo Gi;

Ajulam ha tutu mu anwua:

8 Me ka ihe-efu na okwu-ugha di anya n’ebe m’nọ:

Enyelam ọnọdu-ob͕eye ma-ọbu àkù;

Me ka m’rie nri rurum:

9 Ka afọ we ghara ijum, m’we gọ agọ, si, Ònye bu Jehova?

Ma-ọbu ka ewe ghara inapum ihe nile, m’we zu ori,

We were aha Chinekem me ihe ọjọ.

10 Ekpèla orù ikpè n’iru onye-nwe-ya,

Ka o we ghara ikọcha gi, ikpé ewe ma gi.

11 Ọb͕ọ di nke nākọcha nna-ha,

Ha adighi-agọzi kwa nne-ha.

12 Ọb͕ọ di nke di ọcha n’anya-ha,

Ma orurú-inyi-ha nke nēsì ísì ka anāsachapughi.

13 Ọb͕ọ di, le ka anya-ha si di elu nke-uku!

Anēbuli kwa mbubere-anya-ha.

14 Ọb͕ọ di, mma-agha ka ezé nile ha bu, ọ bu kwa mma ka ikiri-ezé-ha bu,

Irichapu ndi ewedara n’ala n’uwa, na irichapu ndi-ob͕eye n’etiti madu.

15 Etu nwere umu abua, nāsi, Nye, nye.

Ihe atọ di nke afọ nādighi-eju,

E, anọ di nke nāsighi, O b͕owo:

16 Ala-mọ; na afọ nwayi-àgà;

Na ala afọ miri nējughi;

Na ọku nke nāsighi, O b͕owo.

17 Anya nke nākwa nna-ya emò,

Nke nēleda kwa iṅa nne-ya nti,

Ugolo-ọma nke ndagwurugwu gāghuputa ya,

Umu-ugo gēri kwa ya.

18 Ihe atọ di nke karirim ighọta,

E, anọ nke m’nāmagh:

19 Uzọ ugo n’elu-igwe;

Uzọ agwọ n’elu oké nkume;

Uzọ ub͕ọ n’etiti oké osimiri;

Na uzọ nwoke n’ebe nwa-ab͕ọghọ nọ.

20 Otú a ka uzọ nwayi nākwa iko di;

O riwo ihe, hicha kwa ọnu-ya,

Si, Emeghm ajọ ihe ọ bula.

21 N’okpuru ihe atọ ka uwa maworo jijiji,

N’okpuru ihe anọ kwa, nke ọ nāpughi iburu:

22 N’okpuru orù mb͕e ọ nāghọ eze;

Na onye-nzuzu mb͕e nri nēju ya afọ;

23 N’okpuru nwayi anākpọ asì mb͕e ọ nwere di;

Na nwanyi nēje ozi mb͕e ọ nēketa ihe nwanyi-nwe-ya.

24 Ihe anọ di nke di ntà n’elu-uwa,

Ma ihe ahu mara ihe nke-uku:

25 Danda bu ndi nādighi ike,

Ma ha nēdozi nri-ha na mb͕e okpom-ọku;

26 Coney bu ndi nēnweghi ume,

Ma ha nēdo ulo-ha na nkume di elu;

27 Ọ dighi eze igurube nwere,

Ma mb͕e ha nāpu ha nēkè onwe-ha n’usu, ha nile;

28 Nche-ulo nēji aka-ya nile agigado,

Ma ihe ahu di n’ulo uku eze.

29 Ihe atọ di nke nāzọ ukwu nke-ọma,

E, anọ di nke nēje ije nke-ọma:

30 Ọdum, nke bu dike n’etiti anu nile,

Ọ dighi-esi kwa n’iru ihe ọ bula laghachi azu;

31 Inyinya-agha; na nkpi;

Na eze, nke nbili megide ya nādighi.

32 Ọ buru na i zuzuwo nzuzu n’ibuli onwe-gi,

Ma-ọbu ọ buru na i zubewo nzube ọjọ,

Tukwasi aka-gi n’ọnu-gi.

33 N’ihi na opìpì miri-ara-ehi nēweputa miri-ara raru araru,

Ọzọ, opìpì imi nēweputa ọbara:

Otú a ọpìpì iwe nēweputa ise-okwu.

Categories
ILU

ILU 31

1 Okwu Lemuel, bú eze; ibu eboro ya nke nne-ya ji dọ ya aka na nti.

2 Gini, nwam? gini kwa, nwa nke afọm?

Gini kwa, nwa nke nkwa nile m’kwere?

3 Enyela ndinyom ike-gi,

Enye-kwa-la ihe nēbibi ndi-eze uzọ-gi nile.

4 Ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine, Lemuel, ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine;

Ka ndi-isi ghara kwa isi, Òle ebe ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n’anya di?

5 Ka ha we ghara iṅu, we chezọ ukpuru atọrọ,

We b͕anwe ikpé nke ndi nile ewedara n’ala.

6 Nyenu onye nāla n’iyì ihe-ọṅuṅu nābà n’anya,

Nye-kwa-nu ndi nkpuru-obi-ha di ilu manya-vine:

7 Ya ṅua, we chezọ ob͕eye ọ bu,

Ghara kwa icheta ọnọdu ọjọ ya ọzọ.

8 Saghere onye-ob͕i ọnu-gi,

N’okwu-ikpe nke ndi nile nāla n’iyì.

9 Saghe ọnu-gi, kpe ikpe n’ezi omume,

Kpeputa kwa onye ewedara n’ala na ob͕eye.

10 Nwayi nke nējide onwe-ya nke-ọma, ònye gāchọputa ya?

N’ihi na ọnu-ahia-ya kariri ruby nke-uku.

11 Obi di-ya atukwasiwo ya obi,

Ọ dighi kwa ihe-nkwata nākọ nwoke ahu.

12 Nwayi ahu emesowo ya ezi ihe, ọ bughi kwa ihe ọjọ,

Ubọchi nile nke ndu-ya.

13 Ọ chọwo aji-anu na flax,

We nālu ọlu nātọ aka-ya abua utọ.

14 Ọ di ka ub͕ọ onye-ahia;

Site n’ebe di anya ka ọ nēweta nri-ya.

15 O nēbili kwa mb͕e abali nādi kwa,

We nye ulo-ya nri,

Nye kwa umu-ab͕ọghọ-ya òkè-ha.

16 O zuwo izùzù ọhia, we nweta ya:

Site n’ihe aka-ya abua lutara ka ọ kuworo ubi-vine.

17 O kewo ike n’úkwù-ya dika ihe-ọkiké,

Me kwa ka ogwe-aka-ya abua nwe ume.

18 Ọ matawo na ihe-ahia-ya di nma:

Oriọna-ya adighi-anyu n’abali.

19 Aka-ya abua ka o setiworo n’osisi ikuku ogho,

Ọbu-aka-ya abua ejidesiwo kwa ozele ike.

20 Ọbu-aka-ya ka ọ b͕asapuworo nye onye ewedara n’ala;

E, aka-ya abua ka o setiworo rue ob͕eye aru.

21 Ọ dighi-atu egwu snow, na ọ gēme ulo-ya ihe;

N’ihi na ulo-ya nile nēyi uwe uhie.

22 Ákwà-nb͕abá mara nma ka ọ kpaworo onwe-ya;

Ezi ákwà ọcha na ákwà ododo ka uwe-ya bu.

23 Onye amara n’ọnu-uzọ-ama ka di-ya bu,

Mb͕e ọ nānọdu n’etiti ndi-okenye ala.

24 Uwe ákwà ọcha ka nwayi ahu kpaworo, we re ya;

Ihe-ọkiké ka ọ nyeworo onye-ahia.

25 Ike na ima-nma bu uwe-oyiyi-ya;

Ọ nāchì kwa ubọchi di n’iru ọchì.

26 Ọnu-ya ka ọ sagheworo n’amam-ihe;

Iwu nke ebere dikwasi kwa n’ire-ya.

27 Ọ nēche ojije nile nke èzí-na-ulo-ya nche nke-ọma,

Ọ bughi kwa nri ume-ngwu ka o nēri.

28 Umu-ya ebiliwo, kpọ ya nwayi ihe nāgara nke-ọma;

Di-ya kwa, o nēto kwa ya, si:

29 Ọtutu umu-ndinyom emewo omume kwesiri ndinyom nējide onwe-ha nke-ọma,

Ma gi onwe-gi kachasi ha nile.

30 Amara bu ugha, ima-nma bu kwa ihe-efu:

Ma nwayi nke nātu egwu Jehova, nwayi ahu gēnwe otuto

31 Nyenu ya ihe sitere na nke aka-ya abua lutara;

Ka ọlu-ya nile to kwa ya n’ọnu-uzọ-ama nile.

Categories
EKLISIASTIS

EKLISIASTIS 1

1 Okwu nke Onye-nkpọkọta, bú nwa Devid, bú eze nime Jerusalem.

2 Ihe-efu kachasi ihe-efu nile, ka Onye-nkpọkọta siri; ihe-efu kachasi ihe-efu nile, ihe nile bu ihe-efu.

3 Òle ihe fọduru madu nime ndọb͕u-ya nile nke ọ nādọb͕u onwe-ya n’ọlu n’okpuru anyanwu?

4 Otù ọgbọ alá, ọb͕ọ ọzọ abia; ma uwa nēguzoru mb͕e ebighi-ebi.

5 Ọzọ, anyanwu awawo, anyanwu adawo kwa, ọ bu kwa ila n’ọnọdu-ya ka ọ nēkusi ume ike, bú ebe ọ nāwa.

6 Ifufe nēferu Ndida, we nēfe buruburu rue Ugwu; ọ nēfe buruburu mb͕e nile na nfeghari-ya, ọ bu kwa n’ife buruburu ya ka ifufe feghachiworo.

7 Osimiri nile nērùdaru oké osimiri, ma oké osimiri ejughi eju, rue ebe osimiri nērùda, rue ebe ahu ka osimiri ahu nērùghachi ọzọ.

8 Ihe nile nādọb͕u onwe-ha n’ọlu; madu apughi ikwu ya: afọ adighi-eju anya n’ihu ihe, afọ adighi-eju kwa nti n’inu ihe.

9 Ihe ọ bula nke diworo, nke ahu bu ihe nke gādi; ọzọ, ihe ọ bula nke emeworo, nke ahu bu ihe nke agēme: ọ dighi kwa ihe ọhu di n’okpuru anyanwu.

10 Ọ̀ di ihe nke madu nāsi, Le nka, ihe ọhu ka ọ bu? na mb͕e di anya gara aga ka ọ diworo, na mb͕e nile ebighi-ebi nke buru ayi uzọ.

11 Ọ dighi ncheta diri ọb͕ọ mbu nile: ọzọ kwa, ọ dighi ncheta gādiri ọb͕ọ ikpe-azu nile nke gādi n’ọdi-n’iru, n’etiti ndi nādi mb͕e ha gasiri.

12 Mu onwem, bú Onye-nkpọkọta, abuwo eze Israel nime Jerusalem.

13 M’were kwa obim nye ichọ na iledo site n’amam-ihe ihe bayere ihe nile nke emeworo n’okpuru elu-igwe: nke ahu bu nweda-n’ala jọrọ njọ nke Chineke nyeworo umu nke madu ka ewere ya weda ha n’ala.

14 Ahuwom ọlu nile nke aluworo n’okpuru anyanwu; ma, le, ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe.

15 Ihe nke b͕agọrọ ab͕agọ, apughi ime ka ọ dizie: ọzọ, ihe-nkọnari, apughi iguta ya.

16 Mu onwem kpayere obim uka, si, Mu onwem, le, atukwasiwom n’onwem amam-ihe nke-uku kari onye ọ bula nke burum uzọ nime Jerusalem: e, obim ahuwo amam-ihe na ihe-ọmuma ri nne.

17 M’we were obim nye ima amam-ihe, na ima iwi-ara na nzuzu: amawom na nka bu kwa ichọ ijide ifufe.

18 N’ihi na ọ bu n’ọtutu amam-ihe ka ọtutu nkpasu-iwe di: ọzọ, onye nātukwasi ihe-ọmuma nātukwasi ihe-nb͕u.