Categories
ILU

ILU 13

1 Nwa nke mara ihe nānu idọ-aka-na-nti nna-ya:

Ma onye nākwa emò anughi ibasi-nba-ike.

2 Site na nkpuru nke ọnu-ya ka onye ọ bula gēri ezi ihe:

Ma nkpuru-obi ndi nāghọb͕u aghọb͕u gēri ime-ihe-ike.

3 Onye nēche ọnu-ya nche nēdebe ndu-ya:

Ma onye nāsaghepu eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua, nbibi gādiri ya.

4 Ọ nāchọsi ike, ma ọ dighi ihe o nwere, bú nkpuru-obi onye-ume-ngwu:

Ma nkpuru-obi nke ndi di nkọ, agēme ya ka ọ ma abuba.

5 Okwu-ugha ka onye ezi omume nākpọ asì:

Ma onye nēmebi iwu nēsì ísì, we nwe iru-ihere.

6 Ezi omume nēchebe onye zuru okè n’uzọ:

Ma nmebi-iwu nēme ka onye-nmehie kpùe iru.

7 O nwere onye nēme onwe-ya ọgaranya, ma ọ dighi ihe ọ bula o nwere:

O nwere onye nēme onwe-ya ob͕eye, ma àkù-ya bara uba.

8 Ihe-nb͕aputa nke ndu onye ọ bula bu àkù-ya:

Ma ob͕eye anughi ibasi-nba-ike.

9 Ìhè ndi ezi omume nāṅuri ọṅu:

Ma oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.

10 Nání na nganga ka ilu-ọ̀gù nāputa:

Ma n’aka ndi aduworo ọdu ka amam-ihe di.

11 Àkù nke sitere n’ihe-efu gēbilata:

Ma onye ji aka-ya achikọta ihe gāba uba.

12 Nchere anēchere ogologo mb͕e di anya nēme ka obi nāria ọria:

Ma osisi nke nēnye ndu ka ihe anāchọsi ike bu, mb͕e ọ biaruworo.

13 Onye nēleda okwu Chineke anya nēmebi onwe-ya:

Ma onye nātu egwu ihe enyere n’iwu, onye ahu ka agākwughachi ugwọ.

14 Iwu onye mara ihe bu isi-iyi nke ndu,

Isi n’ọnyà nile nke ọnwu wezuga onwe-gi.

15 Ezi uche nēnye amara:

Ma uzọ ndi-nghọb͕u bu nání nkume.

16 Onye ọ bula nke nwere ezi uche ji ihe-ọmuma alu ọlu:

Ma onye-nzuzu nāb͕asa uche b͕agọrọ ab͕agọ.

17 Onye-ozi nke nēmebi iwu nādabà n’ihe ọjọ:

Ma ukọ̀ nke kwesiri ntukwasi-obi bu ihe nāgwọ madu.

18 Inọ-n’ob͕eye na nlelì gādiri onye nēzere idọ-aka-na-nti:

Ma onye nāriba iba-nba ama ka agāsọpuru.

19 Mb͕e ihe anāchọsi ike mere ọ nātọ nkpuru-obi utọ:

Ma ọ bu ihe-árú n’anya ndi-nzuzu isi n’ihe ọjọ wezuga onwe-ha.

20 Nējeso ndi mara ihe, i gāma kwa ihe:

Ma eyì ndi-nzuzu ka agēmejọ.

21 Ndi-nmehie ka ihe ọjọ nāchu:

Ma ndi ezi omume ka agākwughachi ezi ihe.

22 Ezi madu nēme ka umu umu-ya keta ihe-ya;

Ma ihe anākpakọbara onye ezi omume ka àkù onye-nmehie bu.

23 Ọtutu ihe-oriri di n’ubi ndi-ob͕eye:

Ma o nwere nke anēkpochapu site n’ikpe nābughi ikpe.

24 Onye nēb͕ochi nkpa-n’aka-ya nākpọ nwa-ya asì:

Ma onye nāhu ya n’anya nādọsi ya aka na nti ike.

25 Onye ezi omume nēri ihe rue mb͕e afọ juru nkpuru-obi-ya:

Ma afọ ndi nēmebi iwu, ihe nākọ ya.

Categories
ILU

ILU 14

1 Nwanyi ọ bula nke mara ihe ewuwo ulo-ya:

Ma nwanyi nke b͕agọrọ ab͕agọ n’uche-ya ji aka-ya abua akwada ya.

2 Onye nēje ije n’izi-ezi-ya nātu egwu Jehova:

Ma onye nēsihie n’uzọ-ya nile nēleda Ya anya.

3 N’ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n’uche-ya ka ome npako di:

Ma eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe gēdebe ha.

4 Mb͕e ehi nādighi, ulo anāzù ehi nādi ọcha:

Ma ihe-omume riri nne nēsite n’ike ehi.

5 Onye-àmà nke kwesiri ntukwasi-obi adighi-ekwu okwu-ugha:

Ma onye-àmà okwu-ugha nēkupu okwu-ugha dika ume.

6 Onye nākwa emò achọwo amam-ihe, ma ọ hughi ya:

Ma ihe-ọmuma diri onye-nghọta nfe.

7 Je na ncherita-iru onye-nzuzu,

I gaghi-amata kwa eb͕ub͕ere-ọnu ihe-ọmuma n’aru ya.

8 Amam-ihe onye nwere ezi uche bu ighọta uzọ-ya:

Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu aghughọ.

9 Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n’uche-ha, ikpe-ọmuma nākwa emò ha:

Ma n’etiti ndi ziri ezi ka ihe nātọ Chineke utọ di.

10 Obi mara ilu nke aka ya;

Ọ bu kwa n’ọṅù-ya ka onye nke nābughi nke ya nādighi-agwakọta onwe-ya.

11 Ulo nke ndi nēmebi iwu, agēme ka ọ tọb͕orọ n’efu:

Ma ulo-ikwū nke ndi ziri ezi gāma akwukwọ dika ihe akuku aku.

12 Uzọ di nke ziri ezi n’iru madu,

Ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu.

13 Ọbuná n’ọchì ka ihe nēb͕u obi nb͕u;

Ọzọ, ikpe-azu ọṅù bu iru-újú.

14 Site n’uzọ nile nke aka ya ka afọ gēju onye laghachiworo azu n’obi:

Ma ọ bu site n’onwe-ya ka afọ gēju ezi madu.

15 Onye nēnweghi uche nēkwere okwu nile ọ bula:

Ma onye nwere ezi uche nāghọta ije-ukwu-ya.

16 Onye mara ihe nātu egwu, we si n’ihe ọjọ wezuga onwe-ya:

Ma onye-nzuzu nēwebiga iwe ókè, we nātukwasi obi.

17 Onye nēwe iwe ọsọsọ gēme ihe nke uche b͕agọrọ ab͕agọ:

Ọzọ, onye ọbula nke nēzu nzube ọjọ di iche iche, anākpọ ya asì.

18 Ndi nēnweghi uche eketawo uche b͕agọrọ ab͕agọ:

Ma ndi nwere ezi uche ka anēkpube ihe-ọmuma n’isi.

19 Ndi ọjọ erudawo ala n’iru ndi ezi madu;

Ndi nēmebi iwu kwa n’ọnu-uzọ-ama nile nke onye ezi omume.

20 Ọbuná onye-ab͕ata-obi nke ob͕eye nākpọ ya asì:

Ma ndi nāhu ọgaranya n’anya di ọtutu.

21 Onye nēleda madu-ibe-ya anya nēmehie:

Ma onye nēmere ndi ewedara n’ala amara, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu.

22 Hà adighi-akpafu, bú ndi nēchèputa ihe ọjọ?

Ma ebere na ezi-okwu gādiri ndi nēchèputa ezi ihe.

23 Na ndọb͕u nile nke madu nādọb͕u onwe-ya n’ọlu urù di ya:

Ma okwu eb͕ub͕ere-ọnu nēdubà nání n’ihe-ikọ-ukọ.

24 Okpu-eze nke ndi mara ihe bu àkù-ha:

Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu nání uche b͕agọrọ ab͕agọ.

25 Onye nānaputa nkpuru-obi di iche iche ka onye-àmà nke nēkwu ezi-okwu bu:

Ma onye nēkupu ọtutu okwu-ugha dika ume nāghọ aghughọ.

26 N’egwu Jehova ka ntukwasi-obi siri ike di:

Umu-Ya gēnwe kwa ebe-nb͕abà.

27 Egwu Jehova bu isi-iyi nke ndu,

Isi n’ọnyà nile nke ọnwu wezuga onwe-gi.

28 N’uba nke ndi ọ bula ka ima-nma eze di:

Ma n’ukọ mba ọ bula ka nbibi onye-isi di.

29 Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nwere ọtutu nghọta:

Ma onye nwere obi ọku nēbuli uche b͕agọrọ ab͕agọ.

30 Ndu nke anu-aru ka obi agwọrọ ọria-ya bu:

Ma ire-ure nke ọkpukpu nile ka ekworo bu.

31 Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike nāta Onye kèworo ya uta:

Ma onye nāsọpuru Ya ka onye nēme ob͕eye amara bu.

32 Anenupu onye nēmebi iwu n’ihe ọjọ ya:

Ma onye nwere ebe-nb͕abà n’ọnwu-ya ka onye ezi omume bu.

33 N’obi onye-nghọta ka amam-ihe nānọgide:

Ma n’etiti ndi-nzuzu ka ọ nēme ka amara ya.

34 Ezi omume nēbuli mba:

Ma ihe-ihere nke ndi nile di iche iche ka nmehie bu.

35 Ihe orù nwere uche nātọ eze utọ:

Ma nrubiga-ókè nke iwe-Ya gādi n’aru onye nēweta ihere.

Categories
ILU

ILU 15

1 Ọziza-okwu di nrò nēme ka ọnuma laghachi azu:

Ma okwu nwuta nākpali iwe.

2 Ire ndi mara ihe nēme ka ihe-ọmuma di nma:

Ma ọnu ndi-nzuzu nēkwuwa okwu uche b͕agọrọ ab͕agọ.

3 N’ebe nile ọ bula ka anya abua nke Jehova di,

Nēche ndi ọjọ na ndi bu ezi madu nche.

4 Ire nke nāgwọ madu bu osisi nēnye ndu:

Ma omume b͕agọrọ ab͕agọ nime ya bu ntipia nime mọ madu.

5 Onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ nēlelì idọ-aka-na-nti nna-ya:

Ma onye nāriba iba-nba ama gaghọ onye nwere ezi uche.

6 N’ulo onye ezi omume ka ọtutu àkù di:

Ma n’ihe-omume nke onye nēmebi iwu ka nmekpa-aru di.

7 Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe nēfesa ihe-ọmuma:

Ma obi ndi-nzuzu adighi-eme otú a.

8 Àjà ndi nēmebi iwu bu ihe-árú n’anya Jehova:

Ma ekpere ndi ziri ezi bu ihe nātọ Ya utọ.

9 Ihe-árú n’anya Jehova ka uzọ onye nēmebi iwu bu:

Ma onye nāb͕aso ezi omume ka Ọ nāhu n’anya.

10 Idọ-aka-na-nti ọjọ diri onye nārapu uzọ:

Onye nākpọ iba-nba asì gānwu.

11 Ala-mọ na ebe-ila-n’iyì di n’iru Jehova?

Òbi umu madu gēsi aṅa ghara idi n’iru Ya?

12 Ọ dighi-atọ onye nākwa emò utọ ka abara ya nba:

Ọ bughi onye mara ihe ka ọ gējekuru.

13 Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka iru di nma:

Ma eji ihe-nwuta nke obi tib͕ue mọ madu.

14 Obi onye-nghọta nāchọ ihe-ọmuma:

Ma ọnu ndi-nzuzu nāzù onwe-ya n’uche b͕agọrọ ab͕agọ dika anu-ulo.

15 Ubọchi nile nke onye ewedara n’ala jọrọ njọ:

Ma onye obi-ya di nma nēri oké oriri mb͕e nile.

16 Ọ di nma inwe ihe ntà n’egwu Jehova,

Kari inwe ọtutu àkù ma ọb͕ub͕a-aghara adi ya.

17 Ọ di nma, bú òkè ihe-oriri nke bu nání akwukwọ nri, ma ihu-n’anya di n’ebe ahu,

Kari ehi azùru azù ib͕u eb͕u, ma ikpọ-asì adi ya.

18 Onye-ọnuma nākpali ise-okwu:

Ma onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nēme ka ilu-ọ̀gù di jū.

19 Uzọ onye-ume-ngwu di ka ogige ogwu:

Ma okporo-uzo ndi ziri ezi bu uzọ atuliri atuli.

20 Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria:

Ma madu nzuzu nēleda nne-ya anya.

21 Uche b͕agọrọ ab͕agọ buru onye obi amam-ihe kọrọ ọṅù:

Ma onye-nghọta nēme ka ije-ije-ya zie ezi.

22 Nmebi èchìchè nile di mb͕e ìzù nzuzo nādigh:

Ma n’ọtutu ndi nādu ọdu ka ha nēguzosi ike.

23 Ọṅù diri onye ọ bula n’ọziza-okwu nke ọnu-ya:

Ọzọ, okwu ekwuru na mb͕e-ya, le ka o si di nma nke-uku!

24 Uzọ ndu nārigo elu n’ebe onye nwere uche nọ,

Ka o we si n’ala-mọ di n’okpuru wezuga onwe-ya.

25 Ulo ndi-npako ka Jehova gēropu:

Ma Ọ gēme ka ókè-ala nwanyi di-ya nwuru guzosie ike.

26 Ihe-árú n’anya Jehova ka èchìchè ọjọ nile bu:

Ma okwu-ọnu utọ nile di ọcha.

27 Onye nēmekpa èzí-na-ulo nke aka ya aru ka onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku bu:

Ma onye nākpọ onyinye iri-ngo asì gādi ndu.

28 Obi onye ezi omume nātughari uche n’iza okwu:

Ma ọnu ndi nēmebi iwu nēkwuwa ihe ọjọ di iche iche.

29 Jehova di anya n’ebe ndi nēmebi iwu nọ:

Ma ekpere ndi ezi omume ka Ọ nānu.

30 Ihe nke nēnye anya ìhè nēme ka obi ṅuria:

Ezi ihe anuru anu nēme ka ọkpukpu nile ma abuba.

31 Nti nke nānu iba-nba nke ndu,

N’etiti ndi mara ihe ka ọ gānọ ọnọdu-abali.

32 Onye nēzere idọ-aka-na-nti nāju nkpuru-obi nke aka ya:

Ma onye nānu iba-nba nēnweta obi amam-ihe.

33 Egwù Jehova bu idọ-aka-na-nti nke amam-ihe;

Ọ bu kwa n’iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.

Categories
ILU

ILU 16

1 Madu nwe ido obi n’usoro:

Ma n’aka Jehova ka ọziza ire sitere.

2 Uzọ nile nke onye ọ bula di ọcha n’anya-ya:

Ma Onye nātùzi mọ nile nke madu ka Jehova bu.

3 Turu ọlu-gi nile rue Jehova aru,

Èchìchè-gi nile ewe guzosie ike.

4 Ihe nile ka Jehova kpuru n’ihi Onwe-ya:

E, ọbuná onye nēmebi iwu nāluru ubọchi ihe ọjọ ọlu.

5 Ihe-árú n’anya Jehova ka onye ọ bula bu nke obi-ya di elu:

Site n’aka rue aka, agaghi-agu ya n’onye nēmeghi ihe ọjọ.

6 Eji ebere na ezi-okwu ekpuchi ajọ omume:

Ọ bu kwa egwu Jehova ka madu ji esi n’ihe ọjọ wezuga onwe-ya.

7 Mb͕e uzọ nile nke onye ọ bula nātọ Jehova utọ,

Ọ nēme ọbuná ndi-iro-ya ka ha na ya di n’udo.

8 Ọ di nma inwe ihe ntà n’ezi omume,

Kari inwe ọtutu ihe-omume ma ikpé ziri ezi adighi ya.

9 Obi madu nēchè uzọ-ya:

Ma Jehova nēme ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike.

10 Ọjuju-ase di n’eb͕ub͕ere-ọnu abua nke eze:

Mb͕e ọ nēkpe ikpe ọnu-ya adighi-emekpu emekpu.

11 Ihe-ọtùtù na ihe-osìsì ziri ezi diri Jehova:

Ọlu-Ya ka nkume-osìsì nile nke akpa bu.

12 Ọ buru ndi-eze ihe-árú ime nmebi-iwu:

N’ihi na ezi omume ka oche-eze ji eguzosi ike.

13 Ihe nātọ ndi-eze utọ ka eb͕ub͕ere-ọnu ezi omume bu;

Ọ bu kwa onye nēkwu ihe ziri ezi ka ha nāhu n’anya.

14 Ọnuma eze bu ndi-ozi ọnwu:

Ma onye mara ihe gēkpuchi ya.

15 N’ìhè iru eze ka ndu di;

Mb͕e ihe madu nātọ ya utọ, ọ di ka igwe-oji nke miri-ozuzo ikpe-azu.

16 Inweta amam-ihe, le ka o si di nma nke-uku kari ọla-edo ọma!

Inweta nghọta kwa, le ka o si buru ihe anārọputa nke-uku kari ọla-ọcha!

17 Uzọ atuliri atuli nke ndi ziri ezi bu isi n’ihe ọjọ wezuga onwe-ha:

Onye nēdebe nkpuru-obi-ya nēche uzọ-ya.

18 N’iru ntipia ka npako nāga,

Ọ bu kwa n’iru isu-ngọngọ ka idi-elu nke mọ madu nāga.

19 Ọ di nma inwe mọ di ala n’etiti ndi ewedara n’ala,

Kari isoro ndi-npako kesa ihe akwatara n’agha.

20 Onye nwere uche n’okwu Chineke gāchọta ezi ihe:

Ọzọ, onye nātukwasi Jehova obi, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu.

21 Onye obi-ya mara ihe, agākpọ ya onye-nghọta:

Ọzọ, utọ eb͕ub͕ere-ọnu nātukwasiri nmuta ihe.

22 Isi-iyi nke ndu ka ezi uche bu n’ebe ndi-nwe-ya nọ:

Ma idọ-aka-na-nti nke ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ bu uche b͕agọrọ ab͕agọ.

23 Obi onye mara ihe nēme ka ọnu-ya nwe uche,

Ọ nātukwasi-kwa-ra eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua nmuta.

24 Ub͕ub͕ọ-manu-aṅu ka okwu-ọnu utọ nile bu,

Nke nātọ nkpuru-obi utọ, buru kwa ihe nāgwọ ọkpukpu n’ọria.

25 Uzọ di nke ziri ezi n’iru madu,

Ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu.

26 Ọchichọ-nkpuru-obi nke onye nādọb͕u onwe-ya n’ọlu adọb͕uworo ya onwe-ya n’ọlu;

N’ihi na ọnu-ya erugidewo ya.

27 Onye jọb͕uru onwe-ya nēgwuputa ihe ọjọ:

Ọ bu kwa n’eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka ihe dika ọku nāru aru di.

28 Onye nāb͕akuta Chineke azu nēzisa ise-okwu:

Ọzọ, onye nēkwu okwu-azu nēkewa ezi eyì.

29 Onye nēme ihe-ike nārà madu-ibe-ya urà,

Nēme kwa ka o je ije n’uzọ nādighi nma.

30 Onye nātachi anya-ya abua ichè èchìchè ib͕akuta Chineke azu,

Onye nātabi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua, o mezuwo ihe ọjọ.

31 Okpu-eze nke mara nma ka isi-awọ bu,

N’uzọ ezi omume ka agāhu ya.

32 Ọ di nma, bú onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, kari dike:

Ọ di kwa nma, bú onye nāchi mọ-ya, kari onye nēwere obodo n’agha.

33 Anēfe nzà,

Ma n’aka Jehova ka ikpé-ya nile sitere.

Categories
ILU

ILU 17

1 Ọ di nma iri iberibe achicha kpọrọ nku, ma inọ-n’udo adi ya,

Kari ulo juputara n’àjà anēri nālu ọ̀gù.

2 Orù nke nwere uche gāchi nwa madu nēweta ihere,

Ọ bu kwa n’etiti umu-nne nwa ahu ka ọ gēkere ihe-nketa.

3 Ite eji anucha ihe diri ọla-ọcha, oké ọku di-kwa-ra ọla-edo:

Ma Onye nānwa obi bu Jehova.

4 Onye nēme ihe ọjọ nātọ nti n’ala n’eb͕ub͕ere-ọnu nēkwu ajọ ihe;

Onye-okwu-ugha nāṅa nti ire nēkwu ihe-ila-n’iyì.

5 Onye nākwa ob͕eye emò atawo Onye meworo ya uta:

Onye nāṅuri ọṅu bayere nhuju-anya ndi ọzọ, agaghi-agu ya n’onye nēmeghi ihe ọjọ.

6 Okpu-eze ndi-okenye ka umu umu bu;

Ọzọ, ima-nma nke umu bu nna-ha.

7 Ọ maghi nma n’ebe onye-nzuzu nọ, bú eb͕ub͕ere-ọnu nēkwu ihe makarisiri nma:

Èb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu okwu-ugha gēsi kwa aṅa ma nma n’ebe onye amara aha-ya nọ?

8 Nkume amara ka iri-ngo bu n’anya ndi-nwe-ya:

Ebe ọ bula ọ nēche iru ọ nāgara ya.

9 Onye nēkpuchi njehie nāchọ ihu-n’anya:

Ma onye nēkwu okwu mb͕e na mb͕e nēkewa ezi eyì.

10 Ibasi-nba-ike nābàmi nime onye-nghọta

Kari ka ọgu otiti ise gābà nime onye-nzuzu.

11 Nání nnupu-isi ka onye ọjọ nāchọ;

Ọ bu kwa onye-ozi nēnweghi obi-ebere ka agēziga megide ya.

12 Ka nne-bear nke b͕ara aka umu-ya zute madu,

Kari onye-nzuzu n’uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ.

13 Onye nēnyeghachi ihe ọjọ n’ọnọdu ezi ihe,

Ihe ọjọ agaghi-apu n’ulo-ya.

14 Dika mb͕e madu nērùpu miri, otú a ka isi-nmalite ise-okwu di:

N’ihi ya tutu ilu-ọ̀gù esie ike rapu ya.

15 Onye nāgu onye nēmebi iwu n’onye ezi omume, na onye nāma onye ezi omume ikpe,

Ihe-árú n’anya Jehova ka ha abua bu n’otù.

16 N’ìhi gini kwa ka ego-ọzùzù-ahia di n’aka onye-nzuzu izuta amam-ihe,

Mb͕e obi amam-ihe nādighi?

17 Na mb͕e nile ka eyì nāhu n’anya,

Anāmu kwa-nwa-nne bayere ahuhu.

18 Madu nke obi amam-ihe kọrọ nānara madu n’aka ibu onye-mbe,

Ọ nāghọ onye nọ na mbe n’iru madu-ibe-ya.

19 Onye nāhu njehie n’anya nāhu ilu-ọ̀gù n’anya:

Onye nēme ka ọnu-uzọ-ya di elu nāchọ ntipia.

20 Onye obi-ya b͕agọrọ ab͕agọ adighi-achọta ezi ihe:

Ọzọ, onye nāb͕anwe onwe-ya n’ire-ya gādabà n’ihe ọjọ.

21 Onye nāmu onye-nzuzu ọ gāburu ya iru-újú:

Nna onye-nzuzu adighi-aṅuri kwa ọṅu.

22 Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka aru di nma:

Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u nāmikọ ọkpukpu.

23 Ihe-iri-ngo ka onye nēmebi iwu nēweputa n’uwe-obi-ya,

Iwezuga uzọ nile nke ikpé.

24 N’iru onye-nghọta ka amam-ihe di:

Ma anya abua nke onye-nzuzu di na nsọtu uwa.

25 Ihe nākpasu nna-ya iwe ka nwa nzuzu bu,

Ọ bu-kwa-ra nwanyi muru ya ihe-ilu.

26 Ọzọ, iri onye ezi omume nra adighi nma,

Ọ dighi kwa nma itib͕u ndi amara aha-ha n’ihi izi-ezi-ha.

27 Onye nēb͕ochi okwu-ọnu-ya mara ihe-ọmuma:

Ọzọ, onye mọ-ya juru ajuru bu onye-nghọta.

28 Ọbuná onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ, mb͕e ọ nāb͕a, anāgu ya n’onye mara ihe:

Onye nēkpuchi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu onye-nghọta.

Categories
ILU

ILU 18

1 Ọchichọ nke ya onwe-ya nāchọsi ike ka onye nēkewapu onwe-ya nāchọ,

Ọ bu ezi nzube-ihe nile ka ọ nālusosi ọ̀gù ike.

2 Nghọta adighi-atọ onye-nzuzu utọ,

Kama ọ bu nání ka obi-ya we kpughe onwe-ya.

3 Mb͕e onye nēmebi iwu nābata, nleda-anya abatawo kwa,

Ọ bu kwa nlelì ka ita-uta soro.

4 Miri nke miri emi ka okwu nile nke ọnu madu bu;

Iyi nērù erù ka isi-iyi amam-ihe bu.

5 Ihu onye nēmebi iwu iru-ọma adighi nma,

Iwezuga onye ezi omume n’ikpé.

Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye-nzuzu nābà n’ilu-ọ̀gù,

6 Ọnu-ya nākpọ kwa iti-ihe òkù.

7 Ọnu onye-nzuzu buru ya nbibi,

Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu kwa ọnyà nkpuru-obi-ya.

8 Okwu nile nke onye nēkwu okwu-azu di ka iberibe-nri nātọ utọ nke-uku,

Okwu ahu aridawo kwa n’ime-ime-ala afọ.

9 Ọzọ, onye di ume-ngwu n’ije-ozi-ya,

Onye ahu bu nwa-nne nke onye-nwe nbibi.

10 Ulo-elu di ike ka aha Jehova bu:

Nime ya ka onye ezi omume nāb͕abà, o we nọ n’elu.

11 Àkù ọgaranya bu obodo-ya siri ike,

Ọ di kwa ka mb͕idi di elu nime ntughari-obi-ya nile.

12 N’iru ntipia ka obi madu di elu,

Ọ bu kwa n’iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.

13 Onye nāzaghachi okwu tutu ọ nu,

Uche b͕agaọrọ ab͕agọ na ọnọdu-ihere ka ọ buru ya.

14 Mọ madu gānagide ọria-ya;

Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u, ònye gēburu ya?

15 Obi onye-nghọta nēnweta ihe-ọmuma;

Ọzọ, nti ndi mara ihe nāchọ ihe-ọmuma.

16 Onyinye madu nākwara ya uzọ sara mbara,

Ọ bu kwa n’iru ndi uku ka o nēdu ya je.

17 Onye ezi omume n’anya ndi-ikpe ka onye ahu bu nke buru uzọ kpe ọnu-ya;

Ma madu-ibe-ya abia gwuputa ala okwu-ya.

18 Ife-nzà nēme ka ise-okwu kwusi,

Ọ bu kwa ndi nwere ume ka ọ nēkewa.

19 Nwa-nne ejehieworo megide di ike iwere kari obodo siri ike:

Ise-okwu di kwa ka ihe-ntuchi nile nke-elu.

20 Site na nkpuru nke ọnu onwe-ya ka afọ gēju afọ onye ọ bula;

N’ihe-omume nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya ka afọ gēju ya.

21 Ọnwu na ndu di ire n’aka;

Ọzọ, ndi nāhu ya n’anya gēri nkpuru-ya.

22 Onye chọtaworo nwunye achọtawo ezi ihe,

Ọ gēnweputa kwa n’aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ.

23 Okwu aririọ-amara di iche iche ka ob͕eye nēkwu:

Ma ọgaranya nāza ike ike.

24 Onye nēnwe ọtutu eyì nēnwe ha ibibi onwe-ya:

Ma onye nāhu n’anya di nārapara n’aru kari nwa-nne.

Categories
ILU

ILU 19

1 Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n’izu-okè-ya,

Kari onye eb͕ub͕ere-ọnu-ya b͕agọrọ ab͕agọ n’okwu, onye bu kwa onye-nzuzu.

2 Ọzọ, mb͕e nkpuru-obi nēnweghi ihe-ọmuma ọ dighi nma;

Onye ukwu-ya nēme ngwa nēhie uzọ.

3 Uche b͕agọrọ ab͕agọ nke madu nēkpù uzọ-ya iru;

Ọ bu kwa imegide Jehova ka obi-ya di ọku.

4 Àkù nātukwasiri madu ọtutu eyì:

Ma onye nēnweghi ihe, anēkewapu ya n’ebe eyì-ya nọ.

5 Agaghi-agu onye-àmà okwu-ugha n’onye nēmeghi ihe ọjọ;

Ọzọ, onye nēkupu okwu-ugha dika ume agaghi-ewepuga onwe-ya.

6 Ọtutu madu nāchọ ime ka iru onye amara aha-ya dajua:

Onye ọ bula bu-kwa-ra onye nēnye onyinye eyì.

7 Umu-nne nile nke ob͕eye nākpọ ya asì:

Ǹdi-eyì-ya gēsi aṅa ghara inọ ya n’ebe di anya kari!

Ọ nāb͕aso okwu-ọnu di iche iche nke nābughi ihe.

8 Onye nēnweta obi amam-ihe nāhu nkpuru-obi-ya n’anya:

Onye nēdebe nghọta gāchọta ezi ihe.

9 Agaghi-agu onye-àmà okwu-ugha n’onye nēmeghi ihe ọjọ;

Ọzọ, onye nēkupu okwu-ugha dika ume gāla n’iyì.

10 Idi-pekepeke amaghi onye-nzuzu nma;

Ò gēsi kwa aṅa ma orù nma ichi ndi-isi?

11 Ezi uche madu nēme ka ọ ghara iwe iwe ọsọsọ;

Ọ bu kwa ima-nma-ya igabiga njehie.

12 Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka iwe di ọku nke eze bu;

Ma dika igirigi n’elu ihe-ọkukú ka utọ ihe madu nātọ ya di.

13 Ila-n’iyi nile n’ebe nna-ya nọ ka nwa nzuzu bu:

Ọzọ, miri-ọtutu nātu mb͕e nile ka ise-okwu nwunye bu.

14 Ulo na àkù bu ihe-nketa ndi bu nna nārapu:

Ma Jehova ka nwunye nke nwere uche sitere n’aka.

15 Ume-ngwu nēme ka oké ura dakwasi madu;

Ọ bu kwa nkpuru-obi nke di ume-ngwu ka agu nāgu.

16 Onye nēdebe ihe enyere n’iwu nēdebe nkpuru-obi-ya:

Onye nēleda uzọ-ya nile anya gānwu.

17 Onye nēbinye Jehova ihe ka onye nēmere onye nēnweghi ike amara bu,

Ọ bu kwa nmeso ọma ya ka Ọ gākwughachi ya.

18 Dọ nwa-gi aka na nti, n’ihi na olile-anya di;

Atukwasi-kwa-la obi-gi n’ime ka ọ nwua.

19 Onye oké ọnuma ganāra nra:

N’ihi na ọ buru na i naputa ya, i gēme kwa ya ọzọ.

20 Nuru ndum-ọdu, nara kwa idọ-aka-na-nti,

Ka i we mara ihe n’ikpe-azu-gi.

21 Ọtutu èchìchè di n’obi madu;

Ma ndum-ọdu Jehova, nke ahu gēguzosi ike.

22 Ihe nēme ka anāchọsi madu ike bu ebere-ya:

Ọzọ, ob͕eye di nma kari onye-okwu-ugha.

23 Egwu Jehova nēdubà na ndu:

Onye nwe-kwa-ra ya, ọ gānọ n’afọ-ojuju;

Ihe ọjọ agaghi-eleta ya.

24 Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n’ọkwa,

Ọ gaghi-eweghachi ya ọbuná n’ọnu-ya.

25 Tie onye nākwa emò ihe, onye nēnweghi uche gāghọ onye nwere ezi uche:

Ọzọ, bara onye-nghọta nba, ọ gāghọta ihe-ọmuma.

26 Onye nāpunara nna-ya ihe, nke nēme kwa ka nne-ya b͕alaga,

Bu nwa nēweta ihere nēme kwa ka enwe iru-ihere.

27 Nwam, rapu inu idọ-aka-na-nti

Nke nēme ka i si n’okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma waghari.

28 Onye-àmà nke jọb͕uru onwe-ya nākwa ikpé emò:

Ọzọ, ọnu ndi nēmebi iwu nēloda ajọ ihe.

29 Edoziworo ndi nākwa emò ikpé di iche iche,

Ọ bu kwa iti-ihe di iche iche ka edoziworo nye azu ndi-nzuzu.

Categories
ILU

ILU 20

1 Onye nākwa emò ka manya-vine bu, onye-nkpọtu ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n’anya bu;

Onye ọ bula nke nāwaghari site na ya amaghi ihe.

2 Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka oké ujọ anātu eze bu:

Onye nākpasu Ya iwe nke nērubiga ókè nēmehie megide ndu nke aka ya.

3 Ọ buru madu nsọpuru ikwusi ilu ọ̀gù:

Ma onye ọ bula nke uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ganālusi ọ̀gù ike.

4 N’ihi na ọ bu mb͕e oyi nātu, onye-ume-ngwu agaghi-alu ọlu ubi;

Ọ gāriọ aririọ na mb͕e owuwe-ihe-ubi, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe.

5 Miri nke miri emi ka ndum-ọdu n’obi madu bu;

Ma onye-nghọta gādọputa ya.

6 Ọtutu madu nākpọsa, onye ọ bula ebere nke aka ya:

Ma onye kwesiri ntukwasi-obi, ònye gāchọputa ya?

7 Onye ezi omume nke nējeghari n’izu-okè-ya,

Ndi ihe nāgara nke-ọma ka umu-ya nke gānọchi ya gābu.

8 Eze nke nānọkwasi n’oche ikpé

Ji anya-ya abua afuchapu ihe ọjọ nile.

9 Ònye gāsi, Emewom ka obim di ọcha,

Aghọwom onye di ọcha pua na nmehiem?

10 Uzọ nkume-isì-ihe abua, na uzọ ephah abua,

Ihe-árú n’anya Jehova ka ha abua bu n’otù.

11 Ọbuná nwata nēme ka amata ya site n’omume-ya nile,

Ma ọlu-ya di ọcha, ma o zi-kwa-ra ezi.

12 Nti nke nānu ihe, na anya nke nāhu uzọ,

Jehova emewo ọbuná ha abua.

13 Ahula urá n’anya, ka ewe ghara inapu gi ihe nile;

Meghe anya-gi abua, rijue nri afọ.

14 Ọ jọrọ njọ, ọ jọrọ njọ, ka onye nāzù azù nāsi:

Ma mb͕e ọ laworo n’ulo-ya, mb͕e ahu ka ọ nānya isi.

15 Ọla-edo di, na ọtutu ruby:

Ma ihe di oké ọnu-ahia ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu ihe-ọmuma bu.

16 Chiri uwe-ya, bú onye nọworo onye ala ọzọ na mbe;

N’ọnọdu ndi mba ọzọ nara ya onwe-ya n’ihe-ibe.

17 Ọ nātọ madu utọ, bú nri okwu-ugha;

Ma emesia nkpuru-ájá gēju ya ọnu.

18 Èchìchè nile nēji ndum-ọdu guzosi ike:

Gi were kwa ezi ndum-ọdu bue agha.

19 O nēkpughe ìzù nzuzo, bú onye nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ.

Agwakọta-kwa-la onwe-gi n’onye ji eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua arafu madu.

20 Onye nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya,

Oriọna-ya gānyu na nb͕achi nke ọchichiri.

21 Ihe-nketa nke anānara ọsọsọ na mbu;

Agaghi-agọzi kwa ikpe-azu-ya.

22 Asila, M’gākwughachi ugwọ ihe ọjọ:

Le anya Jehova, Ọ gāzọputa kwa gi.

23 Ihe-árú n’anya Jehova ka uzọ nkume-isì-ihe abua bu;

Ihe-osìsì aghughọ adighi kwa nma.

24 N’aka Jehova ka nzọ-ukwu nile nke madu nēsite;

Màdu gēsi kwa aṅa ghọta uzọ-ya?

25 Ọnyà mara madu ma ọ buru na o were ọsọsọ si, Ọ di nsọ,

Ma mb͕e ọ kwesiri nkwa o we ju ajuju.

26 Ọ nāfuchapu ndi nēmebi iwu, bú eze mara ihe,

Ọ nēme kwa ka wheel nsucha-ọka laghachi n’elu ha.

27 Oriọna Jehova ka ume ndu madu bu,

Nēgwuputa ime-ime-ala afọ nile.

28 Ebere na ezi-okwu nēchebe eze:

O ji kwa ebere akwagide oche-eze-ya.

29 Ima-nma umu-okorọbia ka ike-ha bu:

Ihe-nsọpuru ndi-okenye ka isi-awọ bu kwa.

30 Ufiri-utali nke nēmeru aru nēchichapu ihe ọjọ:

Iti-ihe nēru kwa ime-ime-ala afọ.

Categories
ILU

ILU 21

1 Iyi di iche iche nke juputara na miri ka obi eze bu n’aka Jehova:

N’ebe ọ bula nke nātọ Ya utọ ka Ọ nēwezuga ya.

2 Uzọ ọ bula nke onye ọ bula ziri ezi n’anya-ya abua:

Ma onye nātùzi obi nile ka Jehova bu.

3 Ime ezi omume na ihe ekpere n’ikpe

Bu ihe Jehova nārọputa kari àjà.

4 Anya npako na obi di nganga,

Ọbuná oriọna nke ndi nēmebi iwu, bu nmehie.

5 Èchìchè nile nke onye di nkọ nēdubà nání n’urù:

Ma èchìchè nile nke onye ọ bula nke nēme ngwa nēdubà nání n’ikọ-ukọ.

6 Ikpa àkù site n’ire okwu-ugha

Bu otù nku-ume anēfesa n’ifufe; ndi nāchọ àkù ahu nāchọ ọnwu.

7 Ipunara-madu-ihe nke ndi nēmebi iwu gēkpochapu ha;

N’ihi na ha juru ime ihe ekpere n’ikpe.

8 Ihe b͕agọrọ ab͕agọ nke-uku ka uzọ onye ikpe mab͕uru ya bu:

Ma onye di ọcha n’obi, ọlu-ya ziri ezi.

9 Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo,

Kari inọyere nwayi nēse okwu n’ulo bùru ibù.

10 Nkpuru-obi nke onye nēmebi iwu nāchọsi ihe ọjọ ike:

Madu-ibe-ya abughi onye imere amara n’anya-ya.

11 Mb͕e anēri onye nākwa emò nra, anēme ka onye nēnweghi uche mara ihe:

Ọzọ, mb͕e anēme ka onye nke mara ihe nwe uche, ọ nānara ihe-ọmuma.

12 Onye ezi omume nēnwe uche n’imeso ulo nke onye nēmebi iwu;

Ọ nēkpù ndi nēmebi iwu iru n’ihi ihe ọjọ ha.

13 Onye nēkwuchipu nti-ya n’iti-nkpu nke onye nēnweghi ike,

Ya onwe-ya gākpọ kwa nkpu, ma agaghi-aza ya.

14 Onyinye enyere na nzuzo nādaju iwe,

Iri-ngo ezobere n’uwe-obi nādaju kwa ọnuma siri ike.

15 Ọ buru onye ezi omume ọṅù ime ihe ekpere n’ikpe;

Ma nbibi diri ndi nālu ajọ ihe.

16 Madu nke nēsi n’uzọ ezi uche akpafu,

Nime nkpọkọta nke ndi nādighi ndu ka o gēzu ike.

17 Onye ihe kọrọ ka onye nāhu ọṅù n’anya gābu:

Onye nāhu manya-vine na manu n’anya agaghi-abu ọgaranya.

18 Ihe-nb͕aputa ib͕aputa onye ezì omume ka onye nēmebi iwu bu;

Ọzọ, n’ọnọdu ndi ziri ezi ka onye nāghọb͕u aghọb͕u nọ.

19 Ọ di nma inọ n’ala bú nání ọzara,

Kari inọyere nwayi nēse okwu nākpasu kwa iwe.

20 Àkù anāchọsi ike na manu di n’ebe-obibi nke onye mara ihe;

Ma madu nzuzu nēloda ya.

21 Onye nāb͕aso ezi omume na ebere

Nāchọta ndu, na ezi omume, na nsọpuru.

22 Obodo ndi-dike ka onye nke mara ihe rigobàworo,

O we me ka ike nke ikwesi-ntukwasi-obi-ya rida.

23 Onye nēdebe ọnu-ya na ire-ya

Nēdebe nkpuru-obi-ya ka ọ pua n’ahuhu nile.

24 Onye-nganga na onye-npako, onye nākwa emò bu aha-ya,

Ọ nālu ọlu n’iwe nērubiga ókè nke nganga.

25 Ọchichọ siri ike nke onye-ume-ngwu nēme ka ọ nwua;

N’ihi na aka-ya abua juru ilu ọlu.

26 Ogologo ubọchi nile ka ọ chọsiworo ihe ike nke-uku:

Ma onye ezi omume nēnye, ọ dighi-eb͕ochi kwa aka-ya inye ihe.

27 Àjà nke ndi nēmebi iwu bu ihe-árú:

O gēsi kwa aṅa ghara ibu ihe-árú kari, mb͕e o ji nzube ọjọ weta ya?

28 Onye-àmà okwu-ugha gāla n’iyì:

Ma onye nānu, rue mb͕e ebighi-ebì ka o gēkwu.

29 Onye nēmebi iwu emewo ka iru-ya sie ike:

Ma onye ziri ezi, onye ahu nēdozi uzọ-ya nile.

30 Ọ dighi amam-ihe di, ọ dighi kwa nghọta di,

Ọ dighi kwa ndum-ọdu di, na ncherita-iru Jehova.

31 Inyinya bu ihe anēdoziri ubọchi agha:

Ma Jehova nwe nzọputa.

Categories
ILU

ILU 22

1 Ihe anārọputa ka ezi aha bu kari ọtutu àkù,

Amara di kwa nma kari ọla-ọcha na ọla-edo.

2 Ọgaranya na ob͕eye ezutewo:

Onye meworo ha nile bu Jehova.

3 Onye nwere ezi uche ahuwo ihe ọjọ, we zobe onwe-ya:

Ma ndi nēnweghi uche agabigawo, ewe rie ha nra.

4 Ọkpukpu-ọlu nke obi ume-ala na egwu Jehova

Bu àkù, na nsọpuru, na ndu.

5 Ogwu na ib͕udu di n’uzọ onye b͕agọrọ ab͕agọ n’obi:

Onye nēdebe nkpuru-obi-ya gānọ ha n’ebe di anya.

6 Zulite nwata dika uzọ-ya si di,

Ọbuná mb͕e o mere okenye ọ gaghi-esi nime ya wezuga onwe-ya.

7 Ọgaranya nāchi ndi-ob͕eye,

Ọzọ, orù ka onye nēbiri ego buru onye-nbinye.

8 Onye nāgha ajọ omume dika nkpuru gēwe ajọ ihe dika ihe-ubi:

Nkpa-n’aka nke nrubiga ókè nke iwe-ya gāgwusi kwa.

9 Onye nwere anya ọma, onye ahu ka agāgọzi;

N’ihi na o werewo nri-ya ufọdu nye onye nēnweghi ike.

10 Chupu onye nākwa emò, ise-okwu gāpu kwa;

E, iru-uka na nlelì gākwusi.

11 Onye nāhu idi-ọcha nke obi n’anya,

Eyì-ya ka eze gābu n’ihi amara nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua.

12 Anya abua nke Jehova echebewo onye-ihe-ọmuma,

Ma Ọ nēkpù okwu nile nke onye-nghọb͕u iru.

13 Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n’èzí:

N’etiti amá ka agēb͕um.

14 Ọbù nke miri emi ka ọnu ndinyom nābughi nwunye-gi bu:

Onye Jehova nēwesa oké iwe gādabà nime ya.

15 Uche b͕agọrọ ab͕agọ bu ihe ekekọtaworo n’obi nwata;

Ma nkpa-n’aka nke idọ-aka-na-nti gēme ka ọ di anya n’ebe ọ nọ.

16 Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike ime ka àkù nke aka ya ba uba,

Ya na onye nēnye ọgaranya ihe gābiaru nání ihe-ukọ.

17 Tọ nti-gi n’ala, nu okwu nile nke ndi mara ihe,

Tukwasi kwa obi-gi n’ihe-ọmumam.

18 N’ihi na ọ di utọ mb͕e i debe ha n’afọ-gi,

Mb͕e ha gēguzosi ike n’otù n’elu eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua.

19 Ọ bu ka ntukwasi-obi-gi we di na Jehova

Ka m’meworo ka i mara ha ta, ọbuná gi onwe-gi.

20 Èdetaghm i isi ihe

Nime ndum-ọdu di iche iche na ihe-ọmuma;

21 Ime ka i mara ikwesi-ntukwasi-obi nke okwu-ọnu nile nke ezi-okwu,

Ka i we weghachiri ndi nēzite gi okwu-ọnu nile nke bu ezi-okwu?

22 Anapula onye nēnweghi ike ihe n’ike, n’ihi na onye nēnweghi ike ka ọ bu,

Azọpia-kwa-la onye ewedara n’ala n’ọnu-uzọ-ama:

23 N’ihi na Jehova gēkpe ọnu-ha,

We punara ndi ahu ndu, bú ndi nāpunara ha ihe.

24 Gi na onye-iwe abula eyì;

I gaghi-eso kwa onye-ọnuma ba n’ulo:

25 Ka i we ghara imuta uzọ-ya nile,

We wetara nkpuru-obi-gi ọnyà.

26 Abula otù nime ndi gānara madu n’aka,

Abu-kwa-la otù nime ndi nọ na mbe bayere ugwọ di iche iche.

27 Ọ buru na i nweghi ihe ikwu ugwọ,

N’ìhi gini ka ọ gānapu ihe-ndina-gi n’okpuru gi?

28 Ewezugala ókè-ala nke diworo mb͕e ebighi-ebi,

Nke nna-gi-hà kpaworo.

29 Ì huwo madu nke nēme ngwa n’ije-ozi-ya? n’iru ndi-eze ka o gēguzo onwe-ya;

Ọ gaghi-eguzo onwe-ya n’iru ndi anāmaghi aha-ha.