Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 143

Abù Ọma Devid.

1 Jehova, nuru ekperem; ṅa nti n’aririọ-amaram nile:

N’ikwesi-ntukwasi-obi-Gi zam, na n’ezi omume-Gi.

2 Eji-kwa-la orù-Gi ba n’ikpé;

N’ihi na ọ dighi onye ọ bula nke di ndu bu onye ezi omume n’iru Gi.

3 N’ihi na onye-iro esob͕uwo nkpuru-obim;

Ọ zọpiawo ndum n’ala:

O mewom ka m’biri n’ebe di iche iche b͕ara ọchichri, dika ndi nwuru anwu site na mb͕e ebighi-ebi.

4 Mọm we ghara inwe ike nimem;

Ibobo nānwu obim nimem.

5 Echetawom ubọchi nile nke mb͕e ochie;

Atughariwom uche n’omume-Gi nile:

N’ọlu aka-Gi abua ka m’tughariworo obi.

6 Ab͕asawom akam abua n’ebe I nọ:

Nkpuru-obim di ka ala nke ida-#mbà n’ebe I nọ.Selah

7 Zam ngwa ngwa, Jehova; mọm agwusiwo:

Ezonarilam iru-Gi;

Ka m’we ghara iyi ndi nārida n’olùlù.

8 Mem ka m’nuru ebere-Gi n’ututu;

N’ihi na Gi ka m’tukwasiworo obi:

Mem ka m’mara uzọ nke m’gēje ije nime ya;

N’ihi na Gi ka m’buliworo nkpuru-obim nye.

9 Naputam n’aka ndi-irom, Jehova:

N’ebe I nọ ka m’kpuchiworo onwem.

10 Zím ime ihe di Gi utọ; n’ihi na Gi onwe-gi bu Chinekem:

Mọ-Gi di nma; durum n’ala di lari.

11 N’ihi aha-Gi, Jehova, me ka m’di ndu:

N’ezi omume-Gi me ka nkpuru-obim puta n’ahuhu.

12 Ọzọ, n’ebere-Gi kpochapu ndi-irom,

Me kwa ka ndi nile ndi nākpab͕u nkpuru-obim la n’iyì;

N’ihi na mu onwem bu orù-Gi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 144

Abù Ọma nke Devid.

1 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú oké nkumem, bu,

Onye nēzí akam abua ilu ọ̀gù:

Onye nēzí nkpisi-akam ibu agha:

2 Eberem, na ebem ewusiri ike,

Na ulo-elum, na onye m’nwere ime ka m’b͕apu;

Na ọtam, na onye m’b͕abàworo nime ya;

Onye nāzọda ndim n’okpurum.

3 Jehova, gini ka madu bu, nke I nāmara ya?

Na nwa nke madu, nke I nēchè èchìchè bayere ya?

4 Madu yiri otù nku-ume

Ubọchi-ya nile di ka onyinyo nāgabiga.

5 Jehova, rulata elu-igwe-Gi, we rida:

Metu ugwu aka, ha gākwu kwa anwuru-ọku.

6 Me ka àmùmà b͕uputa, we me ka ha b͕asa;

B͕apu àkú-Gi nile, we chusa ha.

7 Si n’elu setipu aka-Gi;

Dọputam, naputakwam n’ọtutu miri,

N’aka ndi ala ọzọ;

8 Ndi ọnu-ha kwuworo okwu efu,

Aka-nri-ha bu kwa aka-nri ugha.

9 Chineke, abù ọhu ka m’gābùku Gi:

Une nke akwara iri ka m’gēji bùkue Gi abù ọma.

10 Ọ bu onye nēnye ndi-eze nzọputa:

Onye nādọputa Devid, bú orù-Ya, n’ọnu mma-agha jọrọ njọ.

11 Dọputam, nāputakwam n’aka ndi ala ọzọ,

Ndi ọnu-ha kwuworo okwu efu,

Aka-nri-ha bu kwa aka-nri ugha.

12 Mb͕e umu-ayi ndikom di ka ihe akuru n’ala, ndi anēme ka ha bùe ibù mb͕e ha di na nwata;

Umu-ayi ndinyom di ka ogidi nkuku ulo atuworo akika dika ihe-atù nke ulo uku;

13 Ọba-ayi ejuwo, nēweputa ihe nile di iche iche;

Igwè ewu na aturu nile ayi nāmuputa nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, orú nnù na nnù ise orú nnù na nnù ise, n’èzí nile ayi;

14 Anēboju ehi nile ayi ibu nke-ọma;

Ọ dighi nitpú di na mb͕idi-ayi, ọ dighi kwa ọpupu di,

Ọ dighi kwa iti-nkpu di n’amá nile ayi;

15 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu, nke di otú a:

Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu, nke Jehova bu Chineke-ha.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 145

Abù Ọma otuto; nke Devid.

1 M’gēme Gi ka I di elu, Chinekem, bú Eze;

M’gāgọzi kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.

2 Kwa-ubọchi ka m’gāgọzi Gi;

M’gēto kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.

3 Onye uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye anēto nke-uku;

Ọ dighi kwa ngwuputa-ala diri idi-uku-Ya.

4 Otù ọb͕ọ gāja ọlu-Gi nile na nti ọb͕ọ ọzọ,

We gosi idi-ike-Gi nile.

5 N’ima-nma nke nsọpuru nke ebube-Gi,

Na n’oké ọlu-Gi nile, ka m’gātughari uche.

6 Ọ bu kwa ike nke ọlu-Gi nile di egwu ka ha gēkwuputa;

Ọ bu kwa idi-uku-Gi ka m’gākọ akukọ-ya.

7 Ncheta nke iba-uba nke idi-nma-Gi ka ha ga-ekwukwa,

Ọ bu kwa ezi omume-Gi ka ha gēti nkpu ọṅù bayere ya.

8 Onye di amara na onye nwere obi-ebere ka Jehova bu;

Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ di kwa uku n’ebere.

9 Jehova di nma n’ebe ihe nile ekère èkè di;

Obi-ebere-Ya nile dikwasi kwa n’ọlu-Ya nile.

10 Ọlu-Gi nile nēkele Gi, Jehova;

Ndi-ebere-Gi nāgozi kwa Gi.

11 Nsọpuru nke ala-eze-Gi ka ha nēkwuputa,

Ọ bu idi-ike Gi ka ha nēkwu okwu bayere ya;

12 Ime ka umu madu mara idi-ike-Ya nile,

Na nsọpuru nke ima-nma nke ala-eze-Ya.

13 Ala-eze-Gi bu ala-eze rue mb͕e nile ebighi-ebi,

Ọchichi-Gi di kwa n’ọb͕ọ nile.

14 Jehova nākwagide ndi nile nāda ada,

O nēkuli kwa ndi nile nēruda n’ala.

15 Anya ihe nile nēle anya Gi;

Gi onwe-gi nēnye kwa ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya.

16 I nāsaghe aka-Gi,

I nēwere kwa ihe di ihe ọ bula di ndu utọ me ka afọ ju ya.

17 Onye ezi omume ka Jehova bu n’uzọ-Ya nile,

Ọ di kwa ebere n’ọlu-Ya nile.

18 Jehova di nso ndi nile nākpọku Ya,

Bú ndi nile nākpọku Ya n’ezi-okwu.

19 Ihe di ndi nātu egwu Ya utọ ka Ọ gēme;

Ọ bu kwa ntiku-ha ka Ọ gānu, we zọputa ha.

20 Jehova nēdebe ndi nile nāhu Ya n’anya;

Ma ndi nile nēmebi iwu ka Ọ gēkpochapu.

21 Otuto Jehova ka ọnum gēkwu;

Ka anu-aru nile gọzi kwa aha nsọ Ya rue mb͕e nile ebighi-ebi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 146

1 Tonu Ja.

Nkpuru-obim, to Jehova.

2 M’gēto Jehova n’ogologo ndum nile:

M’gābùku Chinekem abù ọma mb͕e m’nọ nādi ndu.

3 Unu atukwasila obi n’aru ndi amara aha-ha,

Ma-ọbu n’aru nwa nke madu, onye ọ nādighi nzọputa o nwere.

4 Mọ-ya nāpu apu, o we laghachi n’ala o si puta;

N’ubọchi ahu èchìchè-ya nile alawo n’iyì.

5 Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye ahu bu nke Chineke nke Jekob bu Onye nēyere ya aka,

Nke olile-anya-ya dikwasi Jehova, bú Chineke-ya:

6 Onye meworo elu-igwe na uwa,

Na oké osimiri, na ihe nile nke di nime ha;

Onye nēdebe ezi-okwu rue mb͕e ebighi-ebi:

7 Onye nēmere ndi anēmeb͕u ihe O kpere n’ikpe;

Onye nēnye ndi agu nāgu nri:

Jehova nātọpu ndi-nkpọrọ;

8 Jehova nēmeghe anya ndi-ìsì;

Jehova nēkuli ndi nēruda n’ala;

Jehova n’ahu ndi ezi omume n’anya;

9 Jehova nēdebe ndi ala ọzọ;

Nwa-nb͕ei na nwayi di-ya nwuru ka Ọ nēme ka ha guzo ọtọ;

Ma uzọ ndi nēmebi iwu ka Ọ nēme ka ọ b͕agọ ab͕agọ.

10 Jehova gābu eze rue mb͕e ebighi-ebi,

Chineke-gi, Zaion, gābu eze rue ọb͕ọ nile.

Tonu Ja.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 147

1 Tonu Ja;

N’ihi na ọ di nma ibùku Chineke-ayi abù ọma;

N’ihi na ọ di utọ, otuto mara nma.

2 Jehova nēwuli Jerausalem elu;

Ndi adọtara n’agha nke Israel ka Ọ nāchikọta.

3 Ọ bu onye nēme ka ndi obi-ha tiwara etiwa diri ndu,

Ọ nēkechi kwa ihe-nb͕u nile ha.

4 Ọ nāguta ọnu-ogugu kpakpando;

Ha nile ka Ọ nākpọ aha.

5 Onye uku ka Onye-nwe-ayi bu, O nwe-kwa-ra ike riri nne;

Nghọta-Ya enweghi ọnu-ọgugu.

6 Jehova nēme ka ndi di ume-ala n’obi guzo ọtọ:

Ọ nēme ka ndi nēmebi iwu di ala ọbuná rue ala.

7 Werenu ekele za Jehova,

Werenu ubọ-akwara bùkue Chineke-ayi abù ọma:

8 Onye ji igwe-oji ekpuchi elu-igwe,

Onye nēdoziri ala miri-ozuzo,

Onye nēme ka ugwu nile pue ahihia.

9 Ọ nēnye anumanu nri-ya,

Nēnye kwa umu-ugolo-ọma nke nākpọlu Ya.

10 Ọ bughi idi-ike nke inyinya nātọ Ya utọ:

Ọ bughi ogwe-ukwu abua nke nwoke nādi Ya utọ.

11 Ihe nātọ Jehova utọ bu ndi nātu egwu Ya,

Ndi nēchere ebere-Ya.

12 Gi Jerusalem, nāja Jehova;

To Chineke-gi, Zaion.

13 N’ihi na O mewo ka ihe-ntuchi nile nke ọnu-uzọ-ama-gi nile di ike;

Ọ gọziwo umu-gi n’etiti gi.

14 Ọ bu onye nēme ka ókè-ala-gi ghọ udo;

Abuba ọka wheat ka O ji me ka i riju afọ.

15 Ọ bu onye nēzisa okwu-ọnu-Ya n’uwa;

Ngwa ngwa ka okwu-Ya nāb͕a ọsọ.

16 Ọ bu onye nēnye snow dika aji-anu;

Ọ nēfesa hoar-frost dika ntu.

17 Ọ nātupu ice-Ya dika iberibe achicha:

Ònye gēguzo n’iru oyi-Ya?

18 Ọ nēzipu okwu-Ya, we b͕aze ha:

Ọ nēme ka ifufe-Ya fe, miri we rùe.

19 Ọ nēgosi Jekob okwu-Ya,

Nēgosi kwa Israel ukpuru-Ya nile na ikpé-Ya nile.

20 O mesoghi mba ọ bula otú a:

Ma ikpé-Ya nile, ha amaghi ha.

Tonu Ja.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 148

1 Tonu Ja.

Tonu Jehova site n’elu-igwe:

Tonu Ya n’ebe di elu.

2 Tonu Ya, ndi-mọ-ozi-Ya nile:

Tonu Ya, usu-ndi-agha-Ya nile.

3 Tonu Ya, anyanwu na ọnwa:

Tonu Ya, kpakpando nile nke ìhè.

4 Tonu Ya, elu-igwe nke elu-igwe,

Na miri nke di n’elu elu-igwe.

5 Ka ha to aha Jehova:

N’ihi na Ya onwe-ya nyere iwu, ewe kè ha.

6 O we me ka ha guzo rue mb͕e nile ebighi-ebi:

Ukpuru ka Ọ nyeworo nke na-agaghi agabiga.

7 Tonu Jehova site n’uwa,

Unu ogologo anu-miri, na ob͕u-miri nile:

8 Ọku, na ákú-miri-ígwé, na snow, na alulu:

Oké ifufe, nke nēme okwu-Ya:

9 Ugwu nile na ugwu ntà nile;

Osisi nile nāmi nkpuru na osisi cedar nile:

10 Anu-ọhia na anu-ulo nile;

Ihe nākpu akpu na nnunu nwere nkù:

11 Ndi-eze uwa na ndi nile di iche iche;

Ndi-isi na ndi-ikpé nile nke uwa:

12 Ma umu-okorọbia ma umu-ab͕ọghọ;

Ndi-agadi, ha na umu-ntakiri:

13 Ka ha too aha Jehova;

N’ihi na emewo ka aha-Ya di elu, nání ya:

Ebube-Ya di n’elu uwa na elu-igwe.

14 O we me ka mpi ndi-Ya nwere di elu,

Iburu ndi-ebere-Ya nile otuto;

Bú umu Israel, ndi di nso Ya.

Tonu Ja.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 149

1 Tonu Ja.

Bùkuenu Jehova abù ọhu,

Bú otuto-Ya nime nkpọkọta ndi-ebere-Ya.

2 Ka Israel ṅuria n’Onye meworo ya:

Ka umu Zaion tegharia egwú ọṅù n’Eze-ha.

3 Ka ha to aha-Ya n’ite-egwú:

Ka ha chiri egwú-otiti na ubọakwara bùkue Ya abù ọma.

4 N’ihi na ihe ndi-Ya nātọ Jehova utọ:

Ọ gēji nzọputa chọ ndi di ume-ala n’obi nma.

5 Ka ndi-ebere ṅuri ọṅu-agha nime nsọpuru:

Ka ha tie nkpu ọṅò n’elu ihe-ndina-ha.

6 Ka nbuli-elu Chineke di n’olu abu ha,

Ka mma-agha nke iru abua di kwa n’aka-ha;

7 Ibọ̀ ọ́bọ̀ n’aru mba nile,

Ibara ndi nile di iche iche nba;

8 Iji nkpọrọ ke ndi-eze-ha,

Na iji nkpọro-ukwu ígwè ke ndi-ha anāsọpuru;

9 Ime n’aru ha ikpé edere n’akwukwọ:

Ihe mara nma ka ọ bu nke ndi-ebere-Ya nile nwere.

Tonu Ja.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 150

1 Tonu Ja.

Tonu Chineke n’ebe nsọ Ya:

Tonu Ya na mbara-ígwé nke ike-Ya.

2 Tonu Ya n’ihi idi-ike-Ya nile:

Tonu Ya dika iba-uba nke idi-uku-Ya si di.

3 Werenu ọfufù opì-ike to Ya:

Chirinu une na ubọ-akwara to Ya.

4 Werenu egwú-otiti na ite-egwú to Ya:

Chirinu ubọ eji akwara kwe na ọ̀jà to Ya:

5 Chirinu ájà nke anānu nke-ọma to Ya:

Chirinu ájà nke nādasi udà ike to Ya.

6 Ka ihe ọ bula nke nēku ume to Ja.

Tonu Ja.

Categories
ILU

ILU 1

1 Ilu di iche iche nke Solomon nwa Devid, bú eze Israel:

2 Ima amam-ihe na idọ-aka-na-nti;

Ighọta okwu-ọnu nile nke nghọta;

3 Inara idọ-aka-na-nti nke inwe-uche,

Na ezi omume na ikpé na izi-ezi;

4 Inye ndi nēnweghi uche ezi uche,

Inye nwa-okorọbia ihe-ọmuma na ìzùzù:

5 Ka onye mara ihe we nu, we tukwasi ihe-nmuta n’amam-ihe-ya;

Ka onye-nghọta we nweta kwa ezi ndum-ọdu:

6 Ighọta ilu, na okwu miri emi;

Okwu nile nke ndi mara ihe, na okwu-omimi nile ha.

7 Egwu Jehova bu nmalite ihe-ọmuma:

Amam-ihe na idọ-aka-na-nti ka ndi b͕agọrọ ab͕agọ n’uche ledaworo anya.

8 Nwam, nuru idọ-aka-na-nti nke nna-gi,

Arapu-kwa-la iwu nne-gi:

9 N’ihi na okpu amara ka ha gāburu isi-gi,

Ihe-inya-n’olu ka ha gāburu olu-gi.

10 Nwam, ọ buru na ndi-nmehie arà gi urà,

Ekwela.

11 Ọ buru na ha asi, Soro ayi je,

Ka ayi che anwu ọbara,

Ka ayi zobe onwe-ayi ijide onye nēmeghi ihe ọjọ n’efu;

12 Ka ayi lo ha na ndu dika ala-mọ,

Bú ndi zuru okè, dika ndi nārida n’olùlù;

13 Ihe nile di oké ọnu-ahia ka ayi gāchọta,

Ayi gākwaju ulo-ayi nile n’ihe ayi kwatara n’agha;

14 Nzà-gi ka i gēfe n’etiti ayi;

Otù akpa-ego ka ayi nile gēnwekọ:

15 Nwam, esola ha je n’uzọ;

B͕ochie ukwu-gi n’iga n’okporo-uzọ-ha:

16 N’ihi na ukwu-ha nāb͕a ọsọ ime ihe ọjọ,

Ha nēme kwa ngwa iwusi ọbara.

17 N’ihi na ọ bu n’efu ka anāb͕asa ub͕u,

N’anya nnunu ọ bula:

18 Ndia Kwa, ọbara onwe-ha ka ha nēche anwu,

Ha nēzobe onwe-ha inwude ndu nke aka ha.

19 Otú a ka uzọ nile nke onye ọ bula nke akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku si di;

Ndu nke ndi-nwe-ya ka ọ nēwepu.

20 Amam-ihe nēti nkpu n’èzí;

N’amá nile ka ọ nēme ka olu-ya da udà;

21 N’isi ebe nile anātu ùzù ka ọ nākpọ òkù;

N’oghere ọnu-uzọ-ama nile,

N’obodo, ka o nēkwu okwu-ọnu-ya nile:

22 Unu ndi nēnweghi uche, rùe ole mb͕e ka unu gāhu enweghi-uche n’anya?

Rùe ole mb͕e ka ndi nākwa emò gāchọsi-kwa-ra onwe-ha ikwa-emò ike?

Rùe ole mb͕e ka ndi-nzuzu gākpọ kwa ihe-ọmuma asì?

23 Laghachinu n’iba-nbam:

Le, m’gāwupuru unu mọm,

M’gēme ka unu mara okwum nile.

24 N’ihi na akpọwom òkù, unu we ju;

Esetipuwom akam, ma ọ dighi onye nāṅa nti;

25 Unu we wezuga ndum-ọdum nile,

Unu achọghi kwa iba-nbam:

26 Mu onwem kwa, na nhuju-anya-unu m’gāchì ọchì;

M’gākwa emò mb͕e oké egwu-unu nābia;

27 Mb͕e oké egwu-unu nābia dika ikuku siri ike,

Mb͕e nhuju-anya-unu nābiaru kwa dika oké ifufe;

Mb͕e ahuhu na nkpà nābiakwasi unu.

28 Mb͕e ahu ka ha gākpọkum, ma m’gaghi-aza;

Ha gāchọsim ike, ma ha agaghi-achọtam:

29 N’ihi na ha kpọrọ ihe-ọmuma asì,

Na n’ihi na ọ bughi egwu Jehova ka ha rọputara:

30 Ha achọghi ndum-ọdum;

Ha lelìri iba-nbam nile:

31 Ha gēri kwa ufọdu nime nkpuru nke uzọ-ha,

Ọ bu kwa ndum-ọdu nile nke aka ha gēju ha afọ.

32 N’ihi na nchighari-azu nke ndi nēnweghi uche gēb͕u ha,

Ọ bu kwa inọ-n’udo nke ndi-nzuzu gēme ka ha la n’iyì.

33 Ma onye nēgem nti gēbi na ntukwasi-obi,

Ọ gānọ kwa jū nātughi oké egwu ihe ọjọ.

Categories
ILU

ILU 2

1 Nwam, ọ buru na i nara okwu-ọnum nile,

Ọ buru kwa na i zobe ihe nile m’nyere n’iwu n’ebe i nọ;

2 Itọrọ amam-ihe nti-gi n’ala,

We wezuga obi-gi inwe nghọta;

3 E, ọ buru na ọ bu nmata ka i nākpọku,

Ọ buru kwa na ọ bu nghọta ka i nēweliri olu-gi;

4 Ọ buru na i chọ ya dika ọla-ọcha,

Ọ buru kwa na ọ bu dika àkù zoro ezo ka i nēgwuputa ya:

5 Mb͕e ahu ka i gāghọta egwu Jehova,

Ọ bu kwa ihe-ọmuma Chineke ka i gāchọta.

6 N’ihi na Jehova nēnye amam-ihe;

N’ọnu-Ya ka ihe-ọmuma na nghọta si aputa:

7 O nēzobere ndi ziri ezi nzube-ihe,

Ọ bu ọta ndi nēje ije n’izu-okè nwere;

8 Iche okporo-uzọ nile nke ikpé,

Ọ bu kwa uzọ ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe.

9 Mb͕e ahu ka i gāghọta ezi omume na ikpé,

Na izi-ezi nile, e, ezi uzọ ọ bula.

10 N’ihi na amam-ihe gābà n’obi-gi,

Ihe-ọmuma gādi kwa nkpuru-obì-gi utọ;

11 Ìzùzù ganēche gi nche,

Nghọta gēchebe gi:

12 Inaputa gi n’uzọ onye ọjọ,

N’aka madu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu;

13 Bú ndi nārapu okporo-uzọ nile nke izi-ezi,

Ka ha we je ije n’uzọ nile nke ọchichiri;

14 Ndi nāṅuri ime ihe ọjọ,

Ha nēteghari egwú ọṅù n’ib͕akuta Chineke azu nke onye ọjọ;

15 Ndi okporo-uzọ nile ha b͕agọrọ ab͕agọ,

Ha nēsihie kwa n’uzọ nile ha:

16 Inaputa gi n’aka nwayi nābughi nwunye-gi,

N’aka nwayi nābughi nwunye-gi nke nēkwu okwu ire-utọ;

17 Nke nārapu di o nwere n’ab͕ọghọ,

Ọb͕ub͕a-ndu nke Chineke-ya kwa, o chezọwo ya:

18 N’ihi na uzọ iridaru ọnwu ka ulo-ya bu,

Ọ bu kwa uzọ iridaru n’ebe ndi nādighi ndu nọ ka uzọ-ya nile bu.

19 Ndi nile ndi nābakuru ya, ha adighi-alata,

Ha adighi-eru kwa okporo-uzọ nile nke ndu:

20 Ka i we je ije n’uzọ ndi di nma,

Debe kwa okporo-uzọ nile nke ndi ezi omume.

21 N’ihi na ndi ziri ezi gēbi n’uwa,

Ndi zuru okè gāfọdu kwa nime ya.

22 Ma ndi nēmebi iwu ka agēbipu n’uwa,

Ọ bu kwa ndi nāghọ aghughọ ka agēropu na ya.