Categories
JOB

JOB 25

1 Bildad, bú onye Shua we za, si,

2 Ọchichi na oké egwu di n’aka-Ya;

O nēme udo n’ebe-Ya nile di elu.

3 Usu-Ya, hà nwere ọnu-ọgugu?

Ònye kwa ka ìhè-Ya nādighi-awakwasi?

4 Màdu gēsi kwa aṅa buru onye ezi omume n’iru Chineke?

Ma-ọbu, ò gēsi aṅa di ọcha n’obi, bú onye nwayi muru?

5 Le, ọbuná ọnwa adighi-eti,

Ọzọ, kpakpando adighi ọcha n’anya-Ya:

6 Ò gēsi kwa aṅa di ọcha, bú madu, nke bu nání ikpuru?

Ma-ọbu nwa nke madu, nke bu nání idide?

Categories
JOB

JOB 26

1 Job we za, si,

2 Ì siwo aṅa yere ya aka, bú onye nēnweghi ike?

Í siwo aṅa zọputa ogwe-aka nke ume nādighi?

3 Ì siwo aṅa dua ya ọdu, bú onye nāmaghi ihe?

Ì siwo kwa aṅa me ka amara nzube-ihe n’uba?

4 Ònye ka i gosiworo okwu?

Ọ̀ bu kwa onye ume-ya siri nime gi puta?

5 Ndi nādighi ndu nāma jijiji

N’okpuru miri na ihe nile nēbi nime ya.

6 Ala-mọ b͕a ọtọ n’iru Ya,

Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ebe-ila-n’iyì nwere.

7 Ọ nēseti Ugwu n’elu ebe tọb͕ọrọ n’efu,

O nēkokwasi kwa uwa n’ihe nābughi ihe.

8 Ọ nēkechi miri n’oké igwe-oji-Ya;

Ma ab͕awaghi igwe-oji n’okpuru ya.

9 Ọ nējisi iru oche-eze-Ya ike,

Nāb͕asa igwe-oji-Ya n’elu ya.

10 Ọ kpawo ókè buruburu n’elu miri,

Rue nsọtu ìhè na ọchichiri.

11 Ogidi nile nke elu-igwe nāma jijiji,

Ibobo nānwu ha site n’ibasi-nba-ike-Ya.

12 Ike-Ya ka O ji me oké osimiri ka o dere du,

Nghọta-Ya kwa ka O ji tib͕u Rehab.

13 Esitere n’aka Mọ-Ya chọ elu-igwe nma;

Aka-Ya adupúwo agwó nāb͕a ọsọ.

14 Le, ndia bu nání nsọtu uzọ-Ya nile:

Le kwa otú ọ di ntà, bú ntakwu okwu anuworo bayere Ya!

Ma éb͕è-elu-igwe nke idi-ike-Ya nile, ònye gāghọta ya?

Categories
JOB

JOB 27

1 Job we malite itu ilu-ya ọzọ, si,

2 Chineke nādi ndu, Onye wezugara ikpém;

Onye puru ime ihe nile nādi kwa ndu, bú Onye mere ka nkpuru-obim di ilu;

3 (N’ihi na ogologo mb͕e nile umem di nimem,

Mọ nke Chineke di kwa n’imem;)

4 N’ezie eb͕ub͕ere-ọnum adighi-ekwu okwu ajọ omume,

Irem adighi-atamu kwa ntamu aghughọ.

5 Ya burum ihe-árú ọ buru na aguam unu na ndi ezi omume:

Rue mb͕e m’kubìri ume m’gaghi-esi n’ebe m’nọ wezuga izu-okèm.

6 Ezi omumem ka m’jideworo, m’gaghia ara kwa ya aka:

Obim adighi-atam uta bayere otù n’ubọchim nile.

7 Ka onye-irom di ka onye nēmebi iwu,

Ka onye nēbili imegidem di kwa ka onye ajọ omume.

8 N’ihi na gini bu olile-anya onye emeruru emeru, mb͕e Chineke nēbipu ya,

Mb͕e Chineke nēsepu nkpuru-obi-ya?

9 Chineke, Ọ̀ gānu iti-nkpu-ya,

Mb͕e nkpab͕u nābiakwasi ya?

10 Ìhe nke Onye puru ime ihe nile gātọ ya utọ?

Ọ̀ gākpọku Chineke na mb͕e nile?

11 M’gēzí unu ihe site n’aka Chineke;

M’gaghi-ezobe ihe nke di n’aka Onye puru ime ihe nile.

12 Le, unu onwe-unu nile ahuwo ya;

N’ìhi gini kwa ka unu nāghọsi ihe-efu?

13 Nka bu òkè madu nēmebi iwu n’ebe Chineke nọ,

Na ihe-nketa nke ndi nēme ka madu ma jijiji, nke ha nānara n’aka Onye puru ime ihe nile.

14 Ọ buru na umu-ya amuba, ọ bu inye mma-agha;

Umu nke putara n’aru-ya agaghi-eriju kwa nri afọ.

15 Agēli ndi-ya fọduru n’ọnwu,

Ndinyom-ya di-ha nwuru agaghi-akwa ákwá.

16 Ọ buru na ọ kwakọba ọla-ọcha dika ájá,

Dozie uwe dika urọ;

17 O gēdozi ya, ma onye ezi omume gēyi ya,

Onye nēmeghi ihe ọjọ gēkè kwa ọla-ọcha.

18 O wuwo ulo-ya dika nla,

Na dika ulo-ntu nke onye-nche meworo.

19 O nēdina buru ọgaranya, ma agaghi-achikọta ya;

Ọ saghewo anya ya abua, ma ọ nọghi.

20 Ihe-egwu nēru ya aru dika miri;

Oké ifufe ezupuwo ya n’abali.

21 Ifufe Iru-anyanwu nēburu ya, o we la;

O we fechapu ya n’ọnọdu-ya.

22 Chinke gātu kwa ya ihe, ghara kwa inwe ọmiko n’aru-ya:

N’aka-Ya ka o gēsi b͕alaga ab͕alaga.

23 Madu gākuru ya aka,

Ma ya ọsọ chupu ya n’ọnọdu-ya.

Categories
JOB

JOB 28

1 N’ihi na ebe ọla-ọcha si aputa di,

Na ebe nke diri ọla-edo ahu ha nānucha anucha.

2 Anēsi n’ájá eweputa ígwè,

Anāwu kwa nkume ighọ ọla.

3 Madu emewo ọchichiri ka o nwe ọgwugwu,

Rue nsọtu nile ka ya onwe-ya nēgwuputa kwa

Nkume nke oké ọchichiri na onyinyo ọnwu.

4 O siwo n’ebe madu nọ dika ọbìa tua ọnu;

Ha bu ndi ukwu nke nāga aga nēchezọ;

Anākwuba ha udọ̀ n’ebe di madu anya, ha nākwufeghari.

5 Ala, nime ya ka nri si aputa:

Ma n’okpuru ya ka atughariworo ya dika ọ bu ọku mere ya.

6 Ọnọdu sapphire ka nkume-ya nile bu,

Ọ nwe-kwa-ra ájá ọla-edo.

7 Ọ bu uzọ nke udele nāmaghi,

Anya agu-nkwọ ahughi kwa ya:

8 Anu-ọhia di nganga azọghi ya ukwu,

Ọdum nāb͕ọ uja agabigaghi kwa n’elu ya.

9 Oké nkume ọmu ka o setipuworo aka-ya imegide;

Okpùwo ugwu iru site na nkpọrọgwu-ha.

10 N’oké nkume nile ka ọ waputaworo uzọ miri si erù;

Anya-ya ahuwo kwa ihe ọ bula di oké ọnu-ahia.

11 O kechiwo osimiri ka ha ghara itu miri;

Ihe-nzuzo ka ọ nēme kwa ka ọ puta ìhè.

12 Ma amam-ihe, òle ebe agāchọputa ya?

Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta?

13 Madu amaghi ọ̀rùrù-ọnu-ya;

Agaghi-achọta kwa ya n’ala ndi di ndu.

14 Ob͕u-miri siri, Ọ bughi nimem ka ọ di:

Oké osimiri si-kwa-ra, Ọ dighi n’akam.

15 Adighi-enye ọla-edo makarisiri nma n’ọnọdu ya,

Adighi-atù kwa ọla-ọcha ibu ọnu-ahia-ya.

16 Adighi-eji ọla-edo ọma nke Ofia,

Adighi-eji kwa onyx di oké ọnu-ahia, ma-ọbu sapphire, tù ya.

17 Adighi-ewere ọla-edo na enyo turu ya:

Ihe ọla-edo anuchara anucha abughi kwa ihe-nb͕anwe-ya.

18 Agaghi-ehota coral na crystal:

E, nnweta amam-ihe kariri ruby.

19 Adighi-ewere topaz nke Etiopia turu ya,

Adighi-eji ọla-edo ọma anāgwaghi agwa tù ya.

20 Ma amam-ihe, òle ebe o si bia?

Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta?

21 N’ihi na ezonariwo ya n’anya ihe nile di ndu,

Esiwo kwa n’anu-ufe nke elu-igwe zopu ya.

22 Ebe-ila-n’iyì na ọnwu siri,

Na nti-ayi ka ayi nuworo akukọ-ya.

23 Chineke aghọtawo uzọ-ya,

Ya onwe-ya amawo kwa ọnọdu-ya.

24 N’ihi na Ya onwe-ya nēlegide ihe anya rue nsọtu nile nke uwa,

N’okpuru elu-igwe nile ka Ọ nāhu ihe;

25 Imere ifufe ihe-ọtùtù;

Miri ka Ọ tùwo-kwa-ra n’ọtùtù.

26 Mbe Ọ tọrọ ukpuru nye miri-ozuzo,

Dozi kwa uzọ nye àmùmà nke éb͕è-elu-igwe:

27 Mb͕e ahu ka Ọ huru ya, we kọ akukọ-ya;

O mere ka o guzosie ike, O gwuputara ala-ya.

28 O we si madu,

Le, egwu Onye-nwe-ayi, nke ahu bu amam-ihe;

Ọzọ, isi n’ihe ọjọ puta bu nghọta.

Categories
JOB

JOB 29

1 Job we malite itu ilu-ya ọzọ, si,

2 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na adim dika m’si di n’ọnwa gara aga,

Dika n’ubọchi nile mb͕e Chineke nēdebem;

3 Mb͕e o nēnwu n’elu isim, bú oriọna-Ya,

Ìhè-Ya ka m’nēji eje ije n’ọchichiri;

4 Otú m’diri n’ubọchi ihe nāgaram nke-ọma,

Mb͕e ìzù nzuzo Chineke dikwasi ulo-ikwūm;

5 Mb͕e Onye puru ime ihe nile nānọyerem,

Mb͕e umu-ntakirim nọrom buruburu;

6 Mb͕e ewere miri-ara-ehi raru araru sa nzọ-ukwum nile,

Mb͕e oké nkume nāwuputaram miri-iyi nke bu nání manu!

7 Mb͕e m’puru je rue ọnu-uzọ-ama n’akuku obodo,

Mb͕e m’nēdozi ebe-ọnọdum n’amá,

8 Umu-okorọbia hurum, zobe onwe-ha,

Ndi kara nká biliri, guzo;

9 Ndi-isi kwubìri okwu nile ha,

Tukwasi ọbu-aka-ha n’ọnu-ha;

10 Anubìri olu ndi-ndú,

Ire-ha rapa-kwa-ra n’okpo-ọnu-ha;

11 N’ihi na nti nurum, we kpọm onye ihe nāgara nke-ọma;

Anya hu-kwa-ram, we b͕aram àmà:

12 N’ihi na m’mere onye ewedara n’ala nke nētikum ka o wepuga onwe-ya,

Ya na nwa-nb͕ei, bú onye nēnweghi onye nēyere ya aka.

13 Ngọzi nke onye nāla n’iyì nābiakwasim:

M’nēme kwa obi nwayi di-ya nwuru ka o tie nkpu ọṅù.

14 Ezi omume ka m’yiri dika uwe, o we werem yikwasi onwe-ya:

Ezi ikpém di ka uwe-nwuda na ákwà-ike-n’isi.

15 Anya ka m’ghọro n’ebe onye-ìsì nọ,

Ukwu n’ebe onye-ngwurọ nọ ka m’ghọ-kwa-ra.

16 Nna ka m’buru ndi-ob͕eye:

Okwu-ikpé m’nāmaghi kwa, anamegwuputa ala-ya.

17 M’we tijie ikiri-ezé nke onye ajọ omume,

Si n’ezé-ya tupu anu ọ dọb͕uru.

18 M’we si, N’akwum ka m’gēkubì ume,

Dika ájá ka m’gēme kwa ka ubọchim ba uba:

19 Awasawo nkpọrọgwum n’ebe miri di,

Igirigi gānọ kwa ọnọdu-abali n’alakam:

20 Nsọpurum di ọhu nimem,

Utam gāb͕anwe kwa ọhu n’akam.

21 Mu ka madu gere nti, we chere,

Ha nānọ kwa dū inu ndum-ọdum.

22 Mb͕e okwum gwusiri, ha adighi-ekwu kwa okwu-ha nke ub͕ò abua;

Okwum nābukwasi kwa ha dika miri-ozuzo.

23 Ha nēcherekwam dika esi echere miri-ozuzo;

Ha saghepu-kwa-ra ọnu-ha dika ọ bu inara miri-ozuzo ikpe-azu.

24 M’chìa ha ọchì, ha adighi-ekwere;

Ha adighi-eme kwa ka ìhè irum da.

25 M’nārọputa uzọ-ha, nọdu kwa ka onye-isi,

Biri kwa dika eze si ebi n’usu-ya,

Dika onye nākasi ndi nēru újú obi.

Categories
JOB

JOB 30

1 Ma ub͕u a ha achìwom ọchì, bú ndi bu nwata karim,

Ndi m’juru ido ndi bu nna-ha n’etiti nkita nke ìgwè ewu na aturu nkem.

2 Ọzọ, ike aka-ha, gini ka ọ gābaram?

Ndi ike nke agadi-ha laworo n’iyì.

3 N’ihi ihe-ukọ na n’ihi agu ha bu ndi nēnweghi ike imu nwa:

Ha bu ndi nēwere ezé-ha kọ̀cha ala ọkpọ-nku, nke bu nkpọnkpọ ebe na ebe tọb͕ọrọ n’efu na mb͕e gara aga.

4 Ndi nānyajipu mallow n’akuku umu-osisi;

Nkpọrọgwu osisi broom bu kwa nri-ha.

5 Anēsi n’etiti madu chupu ha;

Ha nētiso ha nkpu dika anētiso onye-ori.

6 N’ebe nākpata ima-jijiji nke ndagwurugwu ka ha nāghaghi ibi,

Bú ọnu atùru n’ájá na n’oké nkume.

7 N’etiti umu-osisi ka ha nēti nkpu dika inyinya-ibu;

N’okpuru akuba ka ha nējikọta onwe-ha.

8 Ha bu umu ndi-nzuzu, e, umu nke ndi nēnweghi aha;

Apiapuwo ha n’ala.

9 Ma ub͕u a aghọwom abù ha nābù n’ikpọ ubọ-akwara,

M’bu-kwa-ra ha okwu ha nēkwughari.

10 Ha nākpọm ihe-árú, ha nọ n’ebe di anya site n’ebe m’nọ,

Ha eb͕ochighi kwa onwe-ha n’ibu ọnu-miri n’irum.

11 N’ihi na Ọ tọpuwo udọ̀-Ya, we wedam n’ala,

Ha achipuwo kwa bridle n’irum.

12 N’aka-nrim ka ab͕ọ ahu nēbili;

Ukwum abua ka ha nupuworo,

We tulie uzọ nhuju-anya-ha megidem.

13 Ha emebiwo uzọm,

Ha bara nmebim urù,

Bú ndi nēnweghi onye nēyere ha aka.

14 Dika ọ bu na nitpú sara mbara, otú a ka ha nābia:

N’okpuru ntikpọ ahu ka ha turuworo onwe-ha n’arum.

15 Ihe-egwu echighariwo imegidem,

Ha nāchu ọkakam dika ifufe;

Dika igwe-oji ka nzọputam gabigawo-kwa-ra.

16 Ma ub͕u a anāwusi nkpuru-obim nimem dika miri;

Ubọchi nweda-n’ala nējidem.

17 N’abali ọkpukpum nēsiwasi nādapu n’arum,

Ihe-nb͕u nke nārọm árú anọghi n’otù ebe.

18 Site n’iba-uba nke ike nke ọriam uwem nēnwoghari:

Dika ọnu uwe-imem ka ọ nēkem buruburu.

19 Ọ tubàwom n’apiti,

M’we yie ájá na ntu.

20 Anametiku Gi, ma I dighi-azam:

Eguzorom ọtọ, I we lekwasim anya.

21 I nāb͕anwe iburum onye nēnweghi obi-ebere:

I nēji ume aka-Gi kpab͕uem.

22 I nēbulim nye ifufe, I nēme ka o burum dika inyinya,

I ne-atugharim n’elu ebili nmirì.

23 N’ihi na amawom na ọ bu ọnwu ka I gēmem ka m’chigharikuru,

Ru kwa ulo nzute nke diri ihe nile di ndu.

24 N’ezie ọ bughi ihe etikpọrọ etikpọ ka Ọ gēseti aka Ya imegide;

Ọ buru na ọ di n’ọdida-ya, madu gētiku Chineke n’ihi ihe ndia.

25 Àkwaghm ákwá n’ihi onye ubọchi-ya siri ike?

Ò wuteghi nkpuru-obim bayere ob͕eye?

26 Mb͕e m’lere anya ezi ihe, ihe ọjọ bia-kwa-ra;

M’we chere ìhè, ma ọchichiri biara.

27 Ngiri-afọm nile nāb͕o ab͕ọ, ha anọghi jū;

Ubọchi nweda-n’ala nile abiawo n’irum.

28 Ejeghariwom nēji nji, ọ bughi anyanwu mere ya:

Ebiliwom ọtọ nime nkpọkọta madu, tikue Chineke.

29 M’ghọworo nkita-ọhia nwa-nne,

Ghọ-kwa-ra enyi-nnunu eyì.

30 Akpukpọ-arum di oji, nādapu n’arum,

Ọkpukpum erewo kwa ọku site n’ikpọ-nku.

31 Ubọ-akwaram we ghọ iru-újú,

Ọ̀jàm ghọ-kwa-ra olu ndi nākwa ákwá.

Categories
JOB

JOB 31

1 Mu na anyam abua b͕ara ndu;

M’gēsi kwa aṅa lekwasi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke anya?

2 N’ihi na gìni bu òkè nke Chineke sitere n’elu?

Ma-ọbu ihe-nketa nke Onye puru ime ihe nile sitere n’ebe di elu?

3 Ọ̀ bughi nhuju-anya n’ebe onye ajọ omume nọ,

Na oké ahuhu n’ebe ndi nēme ajọ ihe nọ?

4 Yà onwe-ya adighi-ahu uzọm nile,

Gu kwa nzọ-ukwum nile ọnu?

5 Ọ buru na mu na ihe-efu yikọrọ jeghari,

Ọ buru kwa na ukwum ab͕aso aghughọ ọsọsọ;

6 (Ka Ọ tùam n’ihe-ọtùtù ezi omume,

Ka Chineke mara kwa izu-okèm;)

7 Ọ buru na nzọ-ukwum esi n’uzọ wezuga onwe-ya,

Ọ buru kwa na obim ejesowo anyam abua n’azu,

Ọ buru kwa na ọlu ọ bula araparawo n’ọbu-akam abua:

8 Ka m’gha nkpuru, ma ka onye ọzọ rie;

Ka eropu kwa umu nke putara n’arum.

9 Ọ buru na arafue obim ijekuru nwayi,

M’we che anwu n’ọnu-uzọ madu-ibem:

10 Ka nwunyem gwere nwoke ọzọ nri,

Ka ndikom ọzọ ruru kwa ala n’elu ya.

11 N’ihi na nke ahu bu nzube ọjọ;

Ọzọ, nke ahu bu ajọ omume ndi-ikpe gēkpe:

12 N’ihi na ọku ka ọ bu, rue ebe-ila-n’iyì ka ọ nēripia,

Ọ gēropu kwa ihe-ọmumem nile.

13 Ọ buru na ajum okwu-ikpé orùm nwoke ma-ọbu orùm nwayi,

Mb͕e mu na ha nēse okwu:

14 Gini ka m’gēme kwa mb͕e Chineke nēbili?

Mb͕e Ọ nēleta kwa, gini ka m’gāzaghachi Ya?

15 Ọ̀ bughi Onye ahu Nke merem nime afọ mere ya?

Ọ̀ bughi otù Onye dozi-kwa-ra ayi abua nime àkpà-nwa?

16 Ọ buru na eb͕ochiem ndi nēnweghi ike n’ihe nātọ ha utọ,

Ọ buru kwa na emem ka anya nwayi di-ya nwuru dala n’isi;

17 Ọ buru kwa na eriem nbì-aka-nrim, náním,

Ma nwa-nb͕ei erighi nime ya;

18 (Kama site na mb͕e m’di na nwata o tozuru n’akam dika n’aka nna-ya,

Ọ bu kwa site n’afọ nnem ka m’buru nwayi di-ya nwuru onye-ndú;)

19 Ọ buru na ahum madu nāla n’iyì site n’enweghi uwe,

Ọ buru kwa na ob͕eye enweghi ákwà-nb͕okwasi;

20 Ọ buru na úkwù-ya agọzighm,

Ọ buru kwa na esiteghi n’aji aturum me ka aru di ya ọku;

21 Ọ buru na efewom akam megide nwa-nb͕ei,

N’ihi na m’nāhu onye-iye-akam n’ọnu-uzọ-ama:

22 Ka ubum si n’azu-ubu-ya dapu,

Ka etijipu kwa ogwe-akam n’ọkpukpu-ya.

23 N’ihi na nhuju-anya Chineke burum oké egwu,

Site kwa na nweli-elu-Ya apughm ime ihe ọ bula.

24 Ọ buru na emewom ọla-edo ka ọ buru okwukwe efum,

Ọ buru kwa na asiwom ọla-edo ọma, I bu ntukwasi-obim;

25 Ọ buru na aṅuriam ọṅu n’ihi na àkùm riri nne,

Na n’ihi na akam achọtawo àkú uku;

26 Ọ buru na ajum ìhè mb͕e o nēnwu,

Ma-ọbu ọnwa mara nma mb͕e ọ nāga ije;

27 Ewe rafue obim na nzuzo,

Akam we sutu ọnum ọnu:

28 Nke ahu bu kwa ajọ omume ndi-ikpe gēkpe:

N’ihi na n’ime ihe a m’gāgọnari Chineke Nke di n’elu.

29 Ọ buru na aǹuriam n’ọdida nke onye nākpọm asi,

Ma-ọbu kpọte onwem mb͕e ihe ọjọ chọtara ya;

30 (Ma enyeghm okpo-ọnum uzọ imehie

N’iji ọb͕ub͕a-iyi riọ ndu-ya;)

31 Ọ buru na ndikom ulo-ikwūm asighi,

Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi ahu onye nējighi anu-ya riju afọ!

32 Ọ bughi n’èzí ka ọbìa nānọ ọnọdu-abali;

Anam emeghe ọnu-uzọm n’ebe uzọ-amá di.

33 Ọ buru na ekpuchiwom njehiem nile dika Adam,

N’izobe ajọ omumem n’obim,

34 N’ihi na anamama jijiji ìgwè madu bara uba,

Na n’ihi na nleda-anya nke ab͕uru nile nēmem ka m’tua ujọ,

M’we nọ dū, ghara isi n’ọnu-uzọ pua-

35 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na enwerem onye gēgem nti!

(Le, akàràm, ka Onye puru ime ihe nile zam;)

Ọ gādikwam nọ̄ nma ma asi na enwerem akwukwọ nke o deworo, bú nwoke mu na ya nēse okwu!

36 N’ezie n’ubum ka m’gēburu ya;

M’gēke kwa ya n’isim dika okpu-eze.

37 M’gēgosi Ya ọnu-ọgugu nzọ-ukwum;

Dika onye-ndú ka m’gābiaru Ya nso.

38 Ọ buru na alam etie nkpu megidem,

Ọ buru kwa na ọ̀b͕à-ya nile akwakọ ákwá;

39 Ọ buru na eriwom ihe-ọmume-ya nēnyeghi ego,

Ma-ọbu me ka ndi-nwe-ya kubìe ume-ndu-ha:

40 Ka ọhia-ogwu puta n’ọnọdu ọka wheat,

Ka ahihia nēsì ísì ọjọ puta kwa n’ọnọdu ọka barley.

Okwu Job agwusia.

Categories
JOB

JOB 32

1 Ndikom atọ ndia we kwusi iza Job, n’ihi na ya onwe-ya bu onye ezi omume n’anya-ya.

2 Iwe Elaihu nwa Barakel, bú onye Buz, site n’ab͕uru Ram, we di ọku: megide Job ka iwe-ya di ọku, n’ihi na ọ guru onwe-ya n’onye ezi omume kari Chineke.

3 Ọzọ, megide ndi-eyì-ya atọ ka iwe-ya di ọku, n’ihi na ha achọtaghi ihe-ọziza ha gēji ma Job ikpe.

4 Ma Elaihu chere Job n’ikwu okwu, n’ihi na ndi-okenye ka ha bu kari ya onwe-ya n’ubọchi ndu-ha.

5 Elaihu we hu na ihe-ọziza adighi n’onu ndikom atọ ahu, iwe-ya we di ọku.

6 Elaihu nwa Barakel, bú onye Buz, we za, si,

Nwata ka m’bu n’ubọchi ndum, ma unu onwe-unu bu ndi kara nká;

N’ihi ya ka m’rapuru, we tua egwu ikwuputara unu ihe m’mara.

7 Asirim, Ubọchi bara uba gēkwu okwu,

Ọtutu arọ gēme kwa ka amara amam-ihe.

8 N’ezie mọ di nime madu,

Iku-ume nke Onye puru ime ihe nile nēme kwa ka ha ghọta ihe.

9 Ọ bughi ndi uku mara ihe,

Ọ bughi kwa ndi-okenye nāghota ikpé.

10 N’ihi nka ka m’siri, Gem nti;

M’gēkwuputa ihe m’mara, ọbuná mu onwem.

11 Le, echerem okwu-unu,

Anamaṅa nti nghọta-unu,

Rue mb͕e unu gēgwuputa ala okwu nile.

12 E, anamelekwasi unu anya,

Ma, le, ọ dighi onye nēso Job ru uka,

Ma-ọbu nke nāza okwu-ọnu-ya nile, n’etiti unu.

13 Lezienu anya ka unu ghara isi, Ayi achọtawo amam-ihe;

Chineke gāchipu ya, ọ bughi madu:

14 N’ihi na o doghi okwu-ya n’usoro imegidem;

M’gaghi-eji kwa okwu-ọnu-unu zaghachi ya.

15 Ha atuwo ujọ, ha azaghi kwa ọzọ:

Ha ewepuwo okwu nile n’ọnu onwe-ha.

16 M’gēcheta kwa, n’ihi na ha adighi-ekwu,

N’ihi na ha eguzowo, ghara iza ọzọ?

17 M’gāza òkèm, ọbuná mu onwem,

M’gēkwuputa ihe m’mara, ọbuná mu onwem.

18 N’ihi na ejuputaram n’okwu;

Mọ nke di n’afọm akpab͕uwom.

19 Le, afọm di ka manya-vine nke anākwupughi akwupu;

Dika karama-akpukpọ ọhu, ọ nāb͕awa ab͕awa.

20 Ka m’kwue, ka aru we dajuam;

M’gēmeghe eb͕ub͕ere-ọnum, za.

21 Biko, ka m’ghara ihu nwoke ọ bula iru-ọma;

M’gaghi-etu kwa madu aha.

22 N’ihi na amaghm itu aha;

Ọ buru otú a Onye kèrem gēbupum na nwa mb͕e ntà.

Categories
JOB

JOB 33

1 Ma otú ọ di, biko, Job, nuru okwum nile,

Ṅa kwa nti okwum nile.

2 Biko, le, asaghewom ọnum,

Irem ekwuwo n’okpo-ọnum.

3 Okwu-ọnum nile gēkwuputa izi-ezi nke obim:

Ihe eb͕ub͕ere-ọnum mara ka ha kwuworo n’idi-ọcha.

4 Mọ nke Chineke emewom,

Iku-ume nke Onye puru ime ihe nile nēme kwa ka m’di ndu.

5 Ọ buru na i puru, zaghachim;

Do okwu-gi n’usoro n’irum, guzo onwe-gi.

6 Le, mu onwem di ka i si di n’ebe Chineke nọ:

Site n’urọ ka akpurum, ọbuná mu onwem.

7 Le, oké ujọm agaghi-eme ka i tua egwu nke-uku,

Nbigide-akam agaghi-adi kwa arọ́ n’aru-gi.

8 N’ezie i kwuwo na ntim,

Olu okwu nile ka m’nānu kwa, si,

9 Mu onwem di ọcha n’obi, nēnweghi njehie;

Onye nācha ucha ka m’bu, ajọ omume adighi kwa nimem:

10 Le, ihe iji jum aju ka Ọ nāchọputa,

Ọ nāgum n’onye-iro n’ebe Ọ nọ;

11 O nētiye ukwum abua nime ọtọsi,

Nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya.

12 Le, ọ bu na nka ka i nābughi onye ezi omume; m’gāza gi:

N’ihi na Chineke di uku kari madu.

13 Gini mere i ji so Ya se okwu,

Si na Ọ dighi-aza okwu bayere ihe ọ bula Ọ nēme?

14 N’ihi na otù ub͕ò ka Chineke nēkwu,

E, ub͕ò abua, ma madu adighi-ariba ya ama.

15 Na nrọ, bú ọhù nke abali,

Mb͕e oké ura nādakwasi madu,

N’itu-òrù-ura n’elu ihe-ndina;

16 Mb͕e ahu ka Ọ nēkpughe nti madu,

Nākachi kwa idọ-aka-na-nti-ha akàrà,

17 Ime ka madu si n’omume-ya wezuga onwe-ya,

Na isi n’ebe onye di ike nọ kpuche npako;

18 Ọ nēb͕ochi nkpuru-obi-ya n’ida n’olùlù,

Ọ nēb͕ochi kwa ndu-ya n’igabiga site n’ihe-agha.

19 Abawo-kwa-ra ya nba n’ihe-nb͕u n’elu ihe-ndina-ya,

Ya na ilu-ọ̀gù nādigide adigide n’ọkpukpu-ya nile:

20 Nri we nāsọ ndu-ya oyi,

Ihe-oriri nke ọ nāchọsi ike nāsọ kwa nkpuru-obi-ya oyi.

21 Anu-aru-ya nāgwusi, ewe ghara ihu ya anya;

Ọkpukpu-ya nile nke anādighi-ahu anya aputawo kwa n’elu.

22 Nkpuru-obi-ya we nābiaru nso olùlù,

Ndu-ya nābiaru kwa nso ndi nēme ka anwua.

23 Ọ buru na mọ-ozi anọ n’akuku ya,

Bú onye-nsughari, otù onye n’etiti nnù ndi-mọ-ozi abua na ọgu iri,

Igosi madu izi-ezi-ya;

24 Ọ gēme-kwa-ra ya amara, si,

Dọputa ya n’irida n’olùlù,

Achọtawom ihe-nb͕aputa.

25 Anu-aru-ya gādi ọhu kari nke nwata

Ọ nālaghachiru ubọchi okorọbia-ya:

26 Ọ nāriọ Chineke aririọ, ihe-ya we nātọ Ya utọ;

O we were iti-nkpu-ọṅù hu iru-Ya:

O we nyeghachi madu ezi omume-ya.

27 Ọ nābù abù n’iru madu, si,

Emehiewom, me kwa ihe ziri ezi ka ọ buru ajọ omume,

Ma ọ baghm n’ihe:

28 Ọ b͕aputawo nkpuru-obim n’igabiga ba n’olùlù,

Ndum gēle kwa ìhè.

29 Le, ihe ndia nile ka Chineke nālu,

Ub͕ò abua, ma-ọbu ub͕ò atọ, n’ebe madu nọ,

30 Ime ka nkpuru-obi-ya si n’olùlù lata,

Ka ewe were ìhè nke ndu nye ya ìhè.

31 Job, ṅa nti, gem nti:

B͕a nkiti, na mu onwem gēkwu.

32 Ọ buru na okwu adi n’ọnu-gi, zaghachim:

Kwue, n’ihi na ọ dim utọ igu gi n’onye ezi omume.

33 Ọ buru na okwu adighi, gi onwe-gi gem nti:

B͕a nkiti, na m’gēzi gi amam-ihe.

Categories
JOB

JOB 34

1 Elaihu we nāza, si,

2 Ndi-amam-ihe, nurunu okwum nile;

Ndi mara ihe kwa, ṅanun nti.

3 N’ihi na nti nānwa okwu nile,

Okpo-ọnu nēdetu kwa ihe-oriri.

4 Ka ayi rọputara onwe-ayi ikpé:

Ka ayi mara n’etiti onwe-ayi ihe di nma.

5 N’ihi na Job siri, Abum onye ezi omume,

Ma Chineke ewezugawo ikpém:

6 M’gēkwu okwu-ugha megide ikpém?

Ọnyá-àkum adighi ngwọta, ọ bu ezie na njehie adighi.

7 Òle madu di ka Job?

Ọ nāṅu ichì-ọchì dika miri,

8 Nēso kwa ndi nālu ajọ ihe ga ije, buru onye ejikọtara ya na ha,

O we so ndi nēmebi iwu jeghari.

9 N’ihi na ọ siri, Ọ dighi ihe ọ bara madu

Mb͕e ihe Chineke nātọ ya utọ.

10 N’ihi nka, unu ndi nwere obi, genum nti:

Ya buru Chineke ihe-árú, bú imebi iwu;

Ya buru kwa Onye puru ime ihe nile ihe-árú, bú ime ajọ omume.

11 N’ihi na ọlu madu ka Ọ gākwughachi ya,

Na dika uzọ nwoke si di, otú a ka Ọ gēme ka ọ huta.

12 E, n’ezie, Chineke agaghi-emebi iwu,

Onye puru ime ihe nile agaghi-eme kwa ka ikpé buru ajọ omume.

13 Ònye mere Ya onye-nlekọta uwa?

Ma-ọbu ònye doro elu-uwa dum madu bi?

14 Ọ buru na Ọ tukwasi ya obi-Ya,

Ọ buru na Ọ chikọta mọ-ya na iku-ume-ya n’ebe Ọ nọ;

15 Anu-aru nile gēkubìkọ ume,

Mdu gālaghachi kwa n’ájá.

16 Ma ọ buru na i nwere nghọta, nuru nka:

Ṅa nti olu okwum nile.

17 Ọzọ, onye nākpọ ezi ikpé asì, ọ̀ gāchi achi?

Ma-ọbu ì gāma Onye ezi omume di ike ikpe?

18 Àgāsi eze, Gi onye jọb͕uru onwe-gi?

Àgāsi ndi amara aha-ha, Unu ndi-nmebi-iwu?

19 Àgāsi kwa Ya otú a, bú Onye nādighi-ahu ndi-isi iru-ọma,

Nke nādighi-amata kwa ọgaranya kari onye nēnweghi ike?

N’ihi na ọlu nke aka-Ya ka ha nile bu.

20 N’otù ntabi-anya ka ha gānwu, ọbuná n’etiti abali;

Anēme ka ndi ahu me nkpatu, ha nāgabiga kwa,

Anēwezuga kwa onye di ike, nēweghi aka ọ bula.

21 N’ihi na anya-Ya dikwasi uzọ nile nke madu,

Nzọ-ukwu-ya nile ka Ọ nāhu kwa.

22 Ọ dighi ọchichiri di, ọ dighi kwa onyinyo ọnwu di,

Ebe ndi nālu ajọ ihe gēzo onwe-ha.

23 N’ihi na Ọ dighi-atukwasi madu ihe ọzọ,

Ọ bu nání ijekuru Chineke n’ikpé.

24 O nētijisi ndi di ike, ma ngwuputa-ala-ya adighi,

Ọ we neguzo ndi ọzọ n’ọnọdu ha.

25 N’ihi ya Ọ nāmata ọlu nile ha;

O we nēkpù ha iru n’abali, ewe zọpia ha.

26 Dika ndi nēmebi iwu ka O tiworo ha aka

N’ọnọdu ndi nāhu ha anya;

27 N’ihi na ha esiwo n’iso Ya wezuga onwe-ha,

Ha eweghi kwa uche le uzọ-Ya nile anya:

28 Ime ka iti-nkpu nke onye nēnweghi ike biarue Ya ruo,

Iti-nkpu nke ndi ewedara n’ala ka Ọ nānu kwa.

29 Mb͕e Ya onwe-ya nēme ka anọ jū, ònye gāma kwa ikpe?

Mb͕e O nēzobe iru-Ya, ònye gēkiri kwa Ya?

Ma ọ bu n’ebe mba nọ, ma-ọbu n’ebe madu nọ, n’otù aka ahu:

30 Ka madu emeruru emeru we ghara ibu eze,

Ka ndi nēsiri ndi ahu ọnya we ghara idi.

31 N’ihi na ọ̀ di onye ọ bula siworo Chineke,

Eburuwom ahuhu, m’gaghi-eme ajọ omume ọzọ:

32 Ihe m’nāhughi, Gi onwe-gi zím ya:

Ọ buru na emewom ajọ omume, m’gaghi-eme kwa ya ọzọ?

33 Ọ̀ bu site n’ebe i nọ ka Ọ gākwughachi, nke i nāju ya?

N’ihi na gi onwe-gi gārọputa, ọ bughi mu onwem: Ma ihe i maworo, kwue ya.

34 Madu ndi nwere obi gāsim,

Ha na nwoke ọ bula mara ihe nke nēgem nti:

35 Job, ọ bughi n’ọmuma-ihe ka o nēkwu,

Okwu-ya nile adighi kwa n’inwe-uche.

36 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na anwa Job rue mb͕e ebighi-ebi,

N’ihi na ọ nāzaghachi dika ajọ madu.

37 N’ihi na ọ nātukwasi njehie n’elu nmehie-ya,

Ọ nāku aka-ya abua n’etiti ayi,

Nēme kwa ka okwu-ya ba uba megide Chineke.