Categories
JENESIS

JENESIS 31

1 Ọ we nu okwu nile nke umu-ndikom Leban, si, Jekob achiriwo ihe nile nna-ayi nwere; o sitekwara n’ihe nna-ayi nwere kpata àkù a nile.

2 Jekob we hu iru Leban, ma, le, ọ dighi n’ebe ọ nọ dika ọ di na mb͕e gara aga.

3 Jehova we si Jekob, Laghachi n’ala nna-gi-hà, laghachikuru umu-nna-gi; M’gānọyekwara gi.

4 Jekob we zìe kpọ Rechel na Lia bia n’ọhia rue ebe ìgwè ewu na aturu-ya di,

5 ọ si ha, Mu onwem nāhu iru nna-unu, na ọ dighi n’ebe m’nọ dika ọ di na mb͕e gara aga; ma Chineke nke nnam anọyeworom.

6 Unu onwe-unu makwara na ewerewom ikem nile fè nna-unu.

7 Ma nna-unu akwawom emò, we b͕anwe ugwọ-olum ub͕ò iri; ma Chineke ekweghi ya mejọm.

8 Ọ buru na otú a ka ọ nāsi, Ndi turu agwa gābu ugwọ-ọlu-gi; ìgwè ewu na aturu nile we nāmu umu turu agwa: ma ọ buru na otú a ka ọ nāsi, Ndi dere ọcha gābu ugwọ-ọlu-gi; ìgwè ewu na aturu nile we nāmu umu dere ọcha.

9 Chineke we napu anu-ulo nna-unu, nyem.

10 O rue, na mb͕e ìgwè ewu na aturu turu ime, na ewelirim anyam abua, hu nime nrọ, ma, le, nkpi nile nke nāb͕a ìgwè ewu dere ọcha, tu kwa agwa, tu kwa akika.

11 Mọ-ozi nke Chineke we sim nime nrọ ahu, Jekob; m’we si, Lekwam.

12 Ọ si, Biko, welie anya-gi abua, hu, nkpi nile nke nāb͕a ìgwè ewu dere ọcha, tu kwa agwa, tu kwa akika: n’ihi na ahuwom ihe nile Leban nēme gi.

13 Mu onwem bu Chineke nke Betel, ebe i tere ogidi manu, ebe i kwerem nkwa: ub͕u a bilie, si n’ala nka pua, laghachi n’ala nke ọmumu-gi.

14 Rechel na Lia we za, si ya, Ọ̀ di òkè ma-ọbu ihe-nketa ayi nwere n’ulo nna-ayi ọzọ?

15 Ọ̀ bughi na ndi ala ọzọ ka ọ guworo ayi? n’ihi na ọ rewo ayi, ripiasia kwa ego-ayi.

16 N’ihi na àkù nile nke Chineke napuworo nna-ayi, ọ bu ayi na umu-ayi nwe nke ahu: ub͕u a kwa, ihe ọ bula Chineke siri gi, me ya.

17 Jekob we bilie, palie umu-ya ndikom na ndinyom-ya dọkwasi ha n’elu camel-ya;

18 ọ we dupu anu-ulo-ya nile, na àkù-ya nile ọ kpatara, bú anu-ulo o nwetara, nke ọ kpatara na Padan-eram, ilakuru Aisak nna-ya rue ala Kenean.

19 Ma Leban jere ikpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya: Rechel we zue teraphim nke nna-ya nwere n’ori.

20 Jekob we ghọb͕ue Leban onye Siria, n’ighara igosi ya na ya nāb͕alaga.

21 Ọ we b͕alaga, ya onwe-ya na ihe nile ọ nwere; ọ we bilie, gabiga Osimiri Yufretis, che iru-ya n’ugwu Gilead.

22 Ewe gosi Leban n’ubọchi nke-atọ na Jekob b͕alagarari.

23 Ọ we chiri umu-nne-ya tiyere onwe-ya, nāchu ya ije nke ubọchi asa, we chukuru ya n’ugwu Gilead.

24 Chineke we biakute Leban onye Siria nime nrọ abali, si ya, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ikpayere Jekob uka, ma-ọbu nke di nma ma-ọbu nke jọrọ njọ.

25 Leban we rue Jekob aru. Ma Jekob marari ulo-ikwū-ya n’ugwu ahu: Leban na umu-nne-ya makwara ulo-ikwū-ha n’ugwu Gilead.

26 Leban we si Jekob, Gini bu ihe i mere, na i ghọb͕uwom, dupu kwa umum ndinyom dika ndinyom eji mma-agha dọta n’agha?

27 N’ìhi gini ka i b͕ala-gara na nzuzo, we ghọb͕uem? ọ̀ bụ kwa n’ihi gini ka i nēgosighm, ka m’we were ọṅù, were kwa abù, were kwa egwú-otiti, were kwa ubọ-akwara, zilaga gi?

28 ọ̀ bu kwa n’ihi gini ka inekweghim ka m’sutu umum ndikom na umum ndinyom ọnu? ub͕u a i mewo ihe-nzuzu.

29 Ọ diri ike akam imejọ unu: ma Chineke nke nna-unu gwaram okwu n’abali nyahuru, si, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ikpayere Jekob uka, ma-ọbu nke di nma ma-ọbu nke jọrọ njọ.

30 Ma ub͕u a, i lawo n’ezie, n’ihi na agu ulo nna-gi gusiri gi ike, ma n’ìhi gini ka i zuworo chim-hà?

31 Jekob we za, si Leban, N’ihi na aturum egwu: n’ihi na asirim, Ka i we ghara inapum umu-gi ndinyom n’ike.

32 Onye ọ bula i gāchọta chi-gi-hà n’aka-ya, ọ gaghi-adi ndu: n’iru umu-nne-ayi mata ihe nke gi di n’akam, were n’onwe-gi. N’ihi na Jekob amaghi na Rechel zuru ha-ri ori.

33 Leban we ba n’ulo-ikwū Jekob, na n’ulo-ikwū Lia, na n’ulo-ikwū orù-ndinyom abua; ma ọ chọtaghi ha. Ọ we si n’ulo-ikwū Lia pua, ba n’ulo-ikwū Rechel.

34 Ma Rechel wereri teraphim ahu, tinye ha nime ihe eji anọkwasi camel, we nọkwasi ha. Leban we bitu ulo-ikwū ahu nile aka, ma ọ chọtaghi ha.

35 Rechel we si nna-ya, Ya abula ihe iwe iwe di ọku n’anya onye-nwem na apughm ibili n’iru gi; n’ihi na ọ dim dika ọ nādi ndinyom. Ọ we chọsie ike, ma ọ chọtaghi teraphim ahu.

36 Jekob we we iwe di ọku, so Leban se okwu: Jekob we za, si Leban, Gini bu njehiem? gini bu nmehiem, na i chuworom n’ọku ọku?

37 Ọ bu ezie na i bituwo ihem nile aka, ma gini ka i chotaworo nime ihe nile nke ulo-gi? Tọb͕ọ ya ebe a n’iru umu-nnem na umu-nne-gi, ka ha we kpezie n’etiti ayi abua.

38 Orú arọ a ka mu onwem nọyeworo gi; nne-aturu-gi na nne-ewu-gi amukwoghi umu, erighkwa m ebulu nke ìgwè ewu na aturu-gi.

39 Nke anu-ọhia dọb͕uru, ewetaghi m ya nye gi; mu onwem nēdochi ya; site n’akam ka i nāchọ ya, ma-ọbu ihe ezuru n’ehihie ma-ọbu ihe ezuru n’abali.

40 Otú a ka m’nọworo; n’ehihie ọkpukpọ-nku ririm, ọtutu-oyi rikwara m n’abali; uram we fepu n’anyam abua.

41 Orú arọ a ka m’nọworo n’ulo-gi; m’efère gi arọ iri na anọ n’ihi umu-gi ndinyom abua, na arọ isi n’ihi ìgwè ewu na aturu-gi: i b͕anwewo kwa ugwọ-ọlum ub͕ò iri.

42 Ọ buru na Chineke nke nnam, bú Chineke nke Abraham, na Oké Egwù nke Aisak, anọghi n’akukum, n’ezie ub͕u a n’aka efu ka i gēzilagawomri. Nweda-n’alam na ndọb͕u m’ji akam abua nādọb͕u onwem n’ọlu ka Chineke huworo, Ọ̀ we bara gi nba n’abali nyahuru.

43 Leban we za, si Jekob, Umu-ndinyom ndia bu umu-ndinyom nkem, umu-ndikom ndia bu kwa umu-ndikom nkem, ìgwè ewu na aturu ndia bu kwa ìgwè ewu na aturu nkem, ihe ọ bula kwa gi onwe-gi nāhu, nkem ka ọ bu: ma umum ndinyom, gini ka m’gēmere ndia ta, gini ka m’gēme-kwa-ra umu-ha ndikom ndi ha mutara?

44 Ma ub͕u a bia, ka ayi b͕a ndu, mu na gi; ọ gābu kwa ihe-àmà n’etiti mu na gi.

45 Jekob we were nkume, guzo ya ka ọ buru ogidi.

46 Jekob we si umu-nne-ya, Chikọtanu nkume; ha we were nkume me obo: ha we rie nri n’ebe ahu n’akuku obo ahu.

47 Leban we kpọ ya Jega-sahaduta: ma Jekob kpọrọ ya Galeed.

48 Leban we si, Obo a bu ihe-àmà n’etiti mu na gi ta. N’ihi nka akpọrọ aha-ya Galeed:

49 na Mizpa, n’ihi na ọ siri, Ka Jehova che nche n’etiti mu na gi, mb͕e agēzopu ayi, otù onye n’ebe ibe-ya nọ.

50 Ọ buru na i weda umum ndinyom n’ala, ọ buru kwa na i kuru ndinyom tiyere umum ndinyom, ọ dighi onye ayi na ya nọ; le Chineke bu onye-àmà n’etiti mu na gi.

51 Leban we si Jekob, Le obo a, le kwa ogidi a, nke m’tob͕ọworo n’etiti mu na gi.

52 Ihe-àmà ka obo a bu, ihe-àmà ka ogidi a bu kwa, na mu onwem agaghi-agabiga obo a jekuru gi ma-oli, na gi onwe-gi agaghi-agabiga kwa obo a na ogidi a biakutem ma-ọli, ime ihe ọjọ.

53 Chineke nke Abraham, na Chineke nke Nehoa, bú Chineke nke nna-ha, kpe ikpe n’etiti ayi. Jekob we were Oké Egwù nke nna-ya Aisak ṅua iyi.

54 Jekob we chua àjà n’ugwu ahu kpọ umu-nne-ya ka ha rie nri: ha we rie nri, nọ ọnọdu-abali n’ugwu ahu.

55 Leban we bilie n’isi-ututu, sutu umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom ọnu nke-uku, gọzie ha: Leban we la, laghachi n’ebe nke ya.

Categories
JENESIS

JENESIS 32

1 Ma Jekob jere n’uzọ-ya, ndi-mọ-ozi nke Chineke we zute ya.

2 mb͕e ọ huru ha Jekob siri, Ọmuma-ulo-ikwū Chineke ka nka bu: ọ we kpọ aha ebe ahu Mahanaim.

3 Jekob we zie ndi-ozi n’iru ya jekuru Isọ nwa-nne-ya rue ala Sia, bú ọhia Edom.

4 Ọ nye ha iwu, si Otú a ka unu gāsi onye-nwem Isọ; Otú a ka orù-gi Jekob siri, N’ulo Leban ka m’nọworo dika ọbìa, nọgide rue ub͕u a:

5 enwekwara m ehi, na inyinya-ibu, na ìgwè ewu na aturu, na orù-ndikom, na ndinyom nēje ozi: m’we zìe igosi onye-nwem, ihuta amara n’iru gi.

6 Ndi-ozi ahu we laghachikute Jekob, si, Ayi biakutere nwa-nne-gi Isọ, ọzọ kwa, ọ nābia izute gi, ya na nnù ndikom.

7 Jekob we tua egwu nke-uku, obi lọbakwara ya miri: ọ we kera ndi ya na ha nọ, na ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na kamel, n’-omuma-ulo-ikwū abua;

8 ọ si, Ọ buru na Isọ abiarue otù ọmuma-ulo-ikwū, tib͕ue ya, ọmuma-ulo-ikwū nke fọduru gābu ndi b͕apuru ab͕apu.

9 Jekob we si, Chineke nke nnam Abraham, na Chineke nke nnam Aisak, Jehova, Nke nāsim, Laghachi n’ala-gi, laghachikuru umu-nna-gi, M’gēme kwa gi nma:

10 ekwe-sighm ebere nile, na ezi-okwu nile, nke I meworo orù-Gi: n’ihi na nkpa-n’akam ka m’were gabiga Jọdan nka; ma ub͕u a aghọwom ọmuma-ulo-ikwū abua.

11 Biko, naputam n’aka nwa-nnem, n’aka Isọ: n’ihi na mu onwem nātu egwu ya, ma eleghi anya ọ gābia, tib͕ue m, tib͕ukwa nne tinyere umu-ya.

12 Ma Gi onwe-gi siri, Aghaghm ime gi nma, M’gēme kwa nkpuru-gi ka ọ di ka ájá nke oké osimiri, nke anāpughi iguta ọnu n’ihi ọtutu ọ di.

13 O we nọ ọnọdu-abali n’ebe ahu abali ahu; o were kwa ufọdu nime ihe batara n’aka-ya ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma inye Isọ nwa-nne-ya;

14 ọgu nne-ewu iri na orú nkpi, ọgu nne-aturu iri na orú ebulu,

15 orú camel na iri nēnye umu ara na umu-ha, ọgu nne-ehi abua na oké-ehi iri, orú nne-inyinya-ibu na umu-inyinya-ibu iri.

16 Ọ nye ha n’aka ndi-orù-ya, n’ìgwè ichè; ọ si ndi-orù-ya, Gabiganu n’irum, me kwa mbara n’etiti ìgwè na ìgwè.

17 Ọ we nye onye mbu iwu, si, Mb͕e Isọ, bú nwa-nnem, gēzute gi, jua gi, si, Ònye nwe gi? òle ebe i nēje kwa? ọ̀ bu kwa onye nwe ihe ndia di n’iru gi?

18 I gāsi kwa, Orù-gi Jekob nwe ha; onyinye-inata-iru-ọma ka ọ bu ezitere onye-nwem Isọ: ma, le, ya onwe-ya nọ kwa n’azu ayi.

19 Ọ nye kwa onye nke-abua, na onye nke-atọ, na ndi nile nēso ìgwè nile, iwu, si, Dika okwu a si di ka unu gāgwa Isọ, mb͕e unu huru ya;

20 unu gāsi kwa, Ọzọ, le, orù-gi Jekob nọ n’azu ayi. N’ihi na ọ siri, Ka m’were onyinye-inata-iru-ọma nka nke nāga n’irum kpuchie anya-ya, emesia m’gāhu iru-ya; eleghi anya ọ gāhum iru-ọma.

21 Onyinye ahu inata iru-ọma we gabiga n’iru ya: ma ya onwe-ya nọ ọnọdu-abali n’ọmuma-ulo-ikwū-ya abali ahu.

22 Ọ we bilie n’abali ahu, chiri nwunye-ya abua, na ndinyom abua nējere ya ozi, na umu-ya iri na otù, gabiga ngabiga-miri Jakob.

23 O we chiri ha, me ka ha gabiga miri-iyi ahu, me kwa ka ihe o nwere gabiga.

24 O we fọdu Jekob nání ya; otú nwoke we so ya nāb͕a nb͕a rue chi-ọbubọ.

25 Mb͕e ọ huru na ọ pughi ijide ya, o metu isi-ọsu-ya; isi-ọsu Jekob we pua n’ọnọdu-ya, mb͕e ya na ya nab͕a nb͕a.

26 Ọ si Gham ka m’la, n’ihi na chi nābọ. Ọ si, M’gaghi-agha gi ka i la, ma ọ buru na i gọzighim.

27 Ọ si ya, Gini bu aha-gi? Ọ si, Jekob.

28 Ọ si, Ọ bughi Jekob ka agākpọ aha-gi ọzọ, kama Israel: n’ihi na i jisiwo ike n’ebe Chineke nọ na n’ebe madu nọ, i we nwe ike.

29 Jekob we jua ya, si Biko, gosim aha-gi. Ọ si N’ìhi gini kwa ka i nāju ajuju bayere aham? Ọ gọzie ya n’ebe ahu.

30 Jekob we kpọ aha ebe ahu Peniel: n’ihi na ahuwom Chineke iru na iru, ka o kwuru, ewe naputa ndum.

31 Anyanwu we wa-kwasi ya mb͕e ọ gabigara Penuel, ya onwe-ya we nēje nsukwara-achi.

32 N’ihi nka umu Israel adighi-eri akwara nke ọkpukpu-ukwu nke di n’isi-ọsu, rue ta: n’ihi na o meturu isi-ọsu Jekob n’akwara nke ọkpukpu-ukwu.

Categories
JENESIS

JENESIS 33

1 Jekob we welie anya-ya abua, hu, ma le, Isọ nābia, ya na nnù ndikom. Ọ we ke umu-ya nye Lia, nye kwa Rechel, nye kwa ndinyom abua ahu nēje ozi.

2 Ọ we do ndinyom ahu nēje ozi na umu-ha mbu, na Lia na umu-ya n’azu ha, na Rechel na Josef n’azu ha.

3 Ya onwe-ya we gabiga n’iru ha, kpọ isi ala ub͕ò asa, rue mb͕e ọ biaruru nwa-nne-ya nso.

4 Isọ we b͕a ọsọ izute ya, b͕akua ya, dakwasi ya n’olu, sutu ya ọnu: ha we kwa ákwá.

5 Ọ welie anya-ya abua, hu ndinyom na umu-ha; ọ si, Òle ndi bu ndia gi na ha yikọro? Ọ si, Umu nke Chineke nyeworo orù-gi n’amara.

6 Ndinyom ahu ndi nēje ozi we biarue nso, ha onwe-ha na umu-ha, ha kpọ isi ala.

7 Lia na umu-ya biaru-kwa-ra nso, kpọ isi ala: emesia Josef na Rechel biaru-kwa-ra nso, kpọ isi ala.

8 Ọ si, Ọmuma-ulo-ikwū nka nile nke m’zutere, ọ̀ bu gini n’ebe i nọ? Ọ si, Ihuta amara n’iru onye-nwem.

9 Isọ we si, Enwerem ri nne; nwa-nnem, ya diri gi, bú nke i nwere.

10 Jekob we si, É-è, biko, biko, ọ buru na ahutawom amara n’iru gi, gi nara kwa n’akam onyinyem inata iru-ọma: n’ihi na ahuwom iru-gi dika anāhu iru Chineke, ihem we tọ gi utọ.

11 Biko, nara ngọzim nke ewetaworo gi; n’ihi na Chineke emewom amara, na n’ihi na enwerem ihe nile. O rugide ya, ọ we nara ya.

12 Ọ si, Ka ayi bulie ije, ka ayi la, ka m’je kwa n’iru gi.

13 Ọ si ya, Onye-nwem amawo na umum adighi ike, na ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi nke nēnye umu ara di kwa n’akam: ọ buru na achusie ha ike otù ubọchi, ìgwè ewu na aturu nile gānwu kwa,

14 Biko, ka onye-nwem gabiga n’iru orù-ya: ma mu onwem, ka m’nēdu ha nwayọ nwayọ, dika ije-ukwu anu-ulo nke di n’irum, na dika ije-ukwu nke umum si di, rue mb͕e m’gābiakute onye-nwem rue Sia.

15 Isọ we si, Biko, ka m’chiri madu ufọdu nime ndi mu na ha yikọrọ bia, debe n’ebe i nọ. Ọ si, N’ìhi gini kwa? ka m’huta amara n’iru onye-nwem.

16 Isọ we laghachi ubọchi ahu n’uzọ-ya ije Sia.

17 Jekob we bulie ije rue Sukot, wuere onwe-ya ulo, ma-kwa-ra anu-ulo-ya ulo-ntu: n’ihi nka akpọrọ aha ebe ahu Sukot.

18 Jekob we biarue Shelem, bú obodo Shekem, nke di n’ala Kenean, mb͕e o siri na Padan-eram bia; ọ ma ulo-ikwū-ya n’iru obodo ahu.

19 O we zuta òkè ọhia ahu, ebe ọ b͕asara ulo-ikwū-ya, n’aka umu Hemoa, bú nna Shekem, n’ọgu nkpuru-ego ise.

20 O guzo ebe-ichu-àjà ọtọ n’ebe, ahu, kpọ ya, El-elohe-Israel.

Categories
JENESIS

JENESIS 34

1 Daina, bú nwa-nwayi Lia, nke ọ muru nye Jekob, we pua ihu umu-ndinyom ala ahu.

2 Shekem, bú nwa-nwoke Hemoa onye-Haivait, onye-isi ala ahu, we hu ya; o kuru ya, dinayere ya, weda ya n’ala.

3 Nkpuru obi ya we rapara n’aru Daina nwa-nwayi Jekob, ọ hu nwa-ab͕oghọ ahu n’anya, gwa nwa-ab͕ọghb͕ọ ahu okwu nābà ya n’obi.

4 Shekem we gwa nna-ya Hemoa okwu, si, Lutaram nwata-nwayi a na nwunye.

5 Ma Jekob nuru na o merururi Daina nwa-ya nwayi; ma umu-ya ndikom nọyere anu-ulo-ya n’ọhia: Jekob we b͕a nkiti rue mb͕e ha biara.

6 Hemoa, bú nna Shekem, we pukuru Jekob ikpayere ya uka.

7 Umu-ndikom Jekob we si n’ọhia bata mb͕e ha nuru ya: ọ nēwuta ndikom ahu, ha nēwe iwe di ọku nke-uku, n’ihi na ọ bu ihe-nzuzu ka o mere n’Israel, n’idinayere nwa-nwayi Jekob; nke nēkwesighi ime otú a.

8 Hemoa we kpayere ha uka, si, Shekem, bú nwam, nkpuru-obi-ya nāhu nwa-unu nwayi n’anya si-ike: biko, werenu ya nye ya na nwunye.

9 Ka ayi na unu nālurita kwa nwunye; nyenu ayi umu-unu ndinyom, kurukwanu umu-ayi ndinyom n’onwe-unu.

10 Ayi na unu gēbi kwa: ala nka gādi n’iru unu; birinu nāzukwanu ahia nime ya, nwe-kwa-nu ihe-onwunwe nime ya.

11 Shekem we si nna Daina, ọ si kwa umu-nne-ya, Ka m’huta amara n’iru unu, ihe unu gāsikwam m’gēnye.

12 Me ka ọ ba uba nke-uku n’isim, bú ego-ilu-nwunye na onyinye, m’gēnye dika unu gāsim, ma nyenum nwa-ab͕ọghọ ahu na nwunye.

13 Umu-ndikom Jekob we were aghughọ za Shekem na Hemoa nna-ya, we kwue, n’ihi na ọ meruru Daina nwa-nne-ha,

14 ha we si ha, Ayi apughi ime ihe a, iwere nwa-nne-ayi nwayi nye nwoke nke anēbighi úgwù; n’ihi na ihe-ita-uta ka ọ buru ayi:

15 ọ bu nání ma asi na unu eme nka ka ayi gēkwere unu: ọ buru na unu gādi ka ayi, ka ebìe nwoke ọ bula n’etiti unu úgwù;

16 ayi gēnye kwa unu umu-ayi ndinyom, ọ bu kwa umu-unu ndinyom ka ayi gēkuru n’onwe-ayi, ayi na unu gēbi kwa, ghọ otù ndi.

17 Ma ọ buru na unu agaghi-ege ayi nti, ka ebìe unu úgwù; ayi gēkuru kwa nwa-ayi nwayi, la.

18 Okwu-ha nile we di nma n’anya Hemoa, na n’anya Shekem, bú nwa Hemoa.

19 Okorọbia ahu alaghi kwa azu ime ihe ahu, n’ihi na ihe nwa-nwayi Jekob tọrọ ya utọ: ya onwe-ya nwekwara nsọpuru kari ulo nile nke nna-ya.

20 Hemoa na Shekem nwa-ya we bia n’ọnu-uzọ-ama obodo-ha, gwa ndikom obodo-ha okwu, si,

21 Ndikom ndia, ndi-udo ka ha bu n’etiti ayi; ka ha biri kwa n’ala-ayi, zu kwa ahia nime ya; ala-ayi-kwa, le, ọ sara mbara n’aka abua n’iru ha; ka ayi lutara onwe-ayi umu-ha ndinyom na nwunye, ka ayi nye kwa ha umu-ayi ndinyom.

22 Ọ bu nání ma asi na ayi eme nka ka ndikom ahu gēkwere ayi ka ayi na ha biri, ighọ otù ndi, ọ buru na ebìe nwoke, ọ bula n’etiti ayi úgwù, dika ha onwe-ha bu ndi ebiri úgwù.

23 Anu-ulo-ha, na ihe ha nwetara, na anumanu-ha nile, ọ̀ bughi ayi gēnwe ha? ka ayi me nání nka, ka ayi kwere ha, ayi na ha gēbi kwa.

24 Ndi nile ndi si n’ọnu-uzọ-ama obodo-ya nāpu we ge Hemoa, ge kwa Shekem nwa-ya, nti; ewe bìe nwoke ọ bula úgwù, ndi nile ndi si n’ọnu-uzọ-ama obodo-ya nāpu.

25 O rue n’ubọchi nke-atọ, mb͕e o nēb͕u ha nb͕u, na madu abua n’etiti umu-ndikom Jekob, bú Simeon na Livai, umu-nne Daina, were mma-agha-ha n’otù n’otù, biakwasi obodo ahu mb͕e ọ di na ntukwasi-obi, ha we b͕ue ndikom nile.

26 Hemoa na Shekem nwa-ya ka ha b͕u-kwa-ra n’ọnu mma-agha, ha we kuputa Daina n’ulo Shekem, pua.

27 Umu-ndikom Jekob biakwasiri ndi eb͕uru eb͕u, luta obodo ahu n’agha, n’ihi na ha merururi nwa-nne-ha nwayi.

28 Ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha na inyinya-ibu nile ha, na ihe nke di n’obodo ahu, na ihe nke di n’ohia-ya, ka ha chiri;

29 àkù-ha nile, na umu-ntakiri-ha nile, na ndinyom-ha, ka ha dọtara n’agha, luta kwa ha n’agha, bú ihe nile nke di n’ulo-ha.

30 Jekob we si Simeon na Livai, Unu emekpawom aru, n’imem ka m’sì ísì n’etiti ndi bi n’ala nka, n’etiti ndi Kenean, na n’etiti ndi-Perizait: mu onwem kwa, ebe m’nwere ndikom ole-na-ole, ha gāchikọta onwe imegidem, tigbue m, agēme kwa ka m’tọb͕ọrọ n’efu, mu onwem na ulom

31 Ha we si, Ọ̀ gēme nwa-nne-ayi nwayi dika anēme nwayi nākwa iko?

Categories
JENESIS

JENESIS 35

1 Chineke we si Jekob, Bilie, rigoro Betel, biri n’ebe ahu: mekwara Chineke ebe-ichu-àjà n’ebe ahu, bú Onye mere ka i hu Ya anya mb͕e ināb͕apu n’iru Isọ nwa-nne-gi.

2 Jekob we si ulo-ya, ọ si kwa ndi nile ya na ha bi, Wezuganu chi nile nke ndi ala ọzọ nke di n’etiti unu, menu onwe-unu ka unu di ọcha, b͕anwe-kwa-nu uwe-unu:

3 ka ayi bili kwa, rigoro Bet-el; m’gēmekwara Chineke ebe-ichuaja n’ebe ahu, bú Onye nāzam n’ubọchi ahuhum, we nọyerem n’uzọ nke m’jere.

4 Ha we nye Jekob chi nile nke ndi ala ọzọ nke di n’aka-ha, na nb͕a-aka nile nke di na nti-ha; Jekob we zobe ha n’okpuru osisi terebinth nke di nso Shekem.

5 Ha we bulie ije: ujọ nke Chineke we dikwasi obodo nile nke di ha buruburu, ha achughi kwa umu-ndikom Jekob.

6 Jekob we biarue Luz, nke di n’ala Kenean (nke ahu bu Bet-el), ya onwe-ya na ndi nile ya na ha yikọrọ bia.

7 O wue ebe-ichu-aja n’ebe ahu, kpọ ebe ahu El-bet-el: n’ihi na ebe ahu ka Chineke kpughere Onwe-ya nye ya, mb͕e ọ nab͕apu n’iru nwa-nne-ya.

8 Debora, bú nwayi nyere Rebeka ara na nwata, we nwua, elìe ya n’okpuru Bet-el n’okpuru osisi oak: ewe kpọ aha-ya Alon-bakut.

9 Chineke we me ka Jekob hu Ya anya ọzọ, mb͕e o siri na Padan-eram bia, Ọ gọzie ya.

10 Chineke we si ya, Aha-gi bu Jekob: agaghi-akpọ aha-gi Jekob ọzọ, kama Israel gābu aha-gi: Ọ we kpọ aha-ya Israel.

11 Chineke we si ya, Mu onwem bu Chineke Nke puru ime ihe nile: gi mua ọmùmù ba kwa uba; mba na nkpọkọta mba gādi site na gi, ndi-eze gēsi kwa n’úkwù-gi puta;

12 ala nke M’nyere Abraham na Aisak, gi ka M’gēnye ya, ọ bu kwa nkpuru-gi gānọchi gi ka M’gēnye ala nka.

13 Chineke we si n’ebe ọ nọ rigo n’ebe Ọ kpayere ya uka.

14 Jekob we guzo ogidi ọtọ n’ebe ahu ebe Ọ kpayere ya uka, bú ogidi nkume: ọ wusi àjà-ihe-ọṅuṅu n’elu ya, wusa kwa manu n’elu ya.

15 Jekob we kpọ aha ebe ahu ebe Chineke kpayere ya uka Bet-el.

16 Ha we si na Bet-el bulie ije; ma uzọ fọduru ibiaru Efrat: Rechel we nāmu nwa, ime nēmesi kwa ya ike mb͕e ọ nāmu nwa.

17 O rue, mb͕e ime nēmesi, ya ike, na nwayi nke nēle ime siri ya, Atula egwu; n’ihi na nka bu kwa nwa-nwoke i gēnwe.

18 O rue, mb͕e nkpuru-obi-ya nāpu (n’ihi na ọ nwuru), na ọ kpọrọ aha-ya Ben-oni: ma nna-ya kpọrọ ya Benjamin.

19 Rechel we nwua, elìe ya n’uzọ Efrat (nke ahu bu Bet-lehem).

20 Jekob we guzo ogidi ọtọ n’elu ílì-ya: nke ahu bu Ogidi ílì Rechel rue ta.

21 Israel we bulie ije, seti ulọ ikwū ya n’ofè ulo-elu Ida.

22 O rue, mb͕e Israel biri n’ala ahu, na Reuben jere dinayere Bilha, bú iko-nwayi nna-ya: Israel we nu ya.

Ma umu-ndikom Jekob di iri na abua:

23 umu-ndikom Lia; Reuben, bú ọkpara Jekob, na Simeon, na Livai, na Juda, na Isaka, na Zebulun:

24 umu-ndikom Rechel; Josef na Benjamin:

25 umu-ndikom Bilha, bú nwayi nējere Rechel ozi; Dan na Naftali:

26 umu-ndikom Zilpa, bú nwani nējere Lia, ozi; Gad na Asha: ndia bu umu-ndikom Jekob, nke amuru nye ya na Padan-eram.

27 Jekob we biakute Aisak, bú nna-ya, na Mamre, bú Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron), ebe Abraham na Aisak nọrọ dika ọbìa.

28 Ubọchi Aisak we buru ọgu arọ iteghete.

29 Aisak we kubie ume, nwua, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n’ala-mọ, ọ bu agadi, ubọchi-ya jukwara ya afọ: Isọ na Jekob, bú umu-ya ndikom, we lìe ya.

Categories
JENESIS

JENESIS 36

1 Ma ndia bu osuso-ọmumu Isọ (nke ahu bu Edom).

2 Isọ luru ndinyom-ya site n’umu-ndinyom Kenean; Eda nwa-nwayi Ilon onye Het, na Ọhọlibama nwa-nwayi Ana, bú nwa-nnanyi Zibeon onye-Haivait;

3 na Basemat nwa-nwayi Ishmael, nwa-nne-nwayi Nebaiot.

4 Eda we muara Isọ Elifaz; Basemat mukwara Reuel;

5 Ọhọlibama mu-kwa-ra Jeush, na Jalam, na Kora: ndia bu umu-ndikom Isọ, nke amuru nye ya n’ala Kenean.

6 Ma Isọ chiri ndinyom-ya, na umu-ya ndikom, na umu-ya ndinyom, na madu nile nke ulo-ya, na anu-ulo-ya, na anumanu-ya, na ihe nile ọ nwetara, nke ọ kpatarari n’ala Kenean; ọ we si n’iru Jekob, bú nwa-nne-ya, je ala ọzọ.

7 N’ihi na àkù-ha riri nne kari ibikọ n’otù nke ọnọdu-ọbìa-ha nile apughi kwa inagide ha n’ihi anu-ulo-ha.

8 Isọ we biri n’ugwu Sia: Isọ bu Edom.

9 Ma ndia bu osuso-ọmumu Isọ, nna Edom, n’ugwu Sia.

10 Ndia bu aha umu-ndikom Isọ: Elifaz nwa Eda nwunye Isọ, Reuel nwa Basemat nwunye Isọ.

11 Umu-ndikom Elifaz bu Timan, na Oma, na Zefo, na Gatam, na Kenaz.

12 Timna bukwara Elifaz nwa Isọ iko-nwayi; ọ muara Elifaz Amalek: ndia bu umu-ndikom Eda nwunye Isọ.

13 Ndia bu kwa umu-ndikom Reuel; Nahat, na Zera, na Shama, na Miza: ndia bu umu-ndikom Basemat nwunye Isọ.

14 Ndia bu kwa umu-ndikom Ọhọlibama nwa-nwayi Ana, bú nwa-nwayi Zibeon, nwunye Isọ: o we muara Isọ Jeush, na Jalam, na Kora.

15 Ndia bu ndi-isi nke umu Isọ: umu-ndikom Elifaz ọkpara Isọ; Timan onye-isi, Oma onye-isi, Zefo onye-isi, Kenaz onye-isi.

16 Kora onye-isi, Gatam onye-isi, Amalek onye-isi: ndia bu ndi-isi Elifaz n’ala Edom; ndia bu umu-ndikom Eda.

17 Ndia bu kwa umu-ndikom Reuel nwa-nwoke Isọ; Nahat onye-isi, Zera onye-isi, Shama onye-isi, Miza onye-isi: ndia bu ndi-isi Reuel n’ala Edom; ndia bu umu-ndikom Basemat nwunye Isọ.

18 Ndia bu kwa umu-ndikom Ọhọlibama nwunye Isọ; Jeush onye-isi, Jalam onye-isi, Kora onye-isi: ndia bu ndi-isi Ọhọlibama nwa-nwayi Ana, nwunye Isọ.

19 Ndia bu umu Isọ, ndia bu kwa ndi-isi-ha: nke ahu bu Edom.

20 Ndia bu umu-ndikom Sia onye Hoa, ndi bi n’ala ahu; Lotan, na Shobal, na Zibeon, na Ana,

21 na Dishon, na Iza Dishan: ndia bu ndi-isi ndi Hoa, umu Sia n’ala Edom.

22 Umu-ndikom Lotan bu Hori na Himam; nwanne-nwayi Lotan bu kwa Timna.

23 Ndia bu kwa umu-ndikom Shobal; Alvan, na Manahat, na Ibal, na Shefo, na Onam.

24 Ndia bu kwa umu-ndikom Zibeon; Aia, na Ana: onye ahu bu Ana onye hutara isi-iyi nke miri di ọku n’ọzara, mbe ọ nāzù inyinya-ibu Zibeon, bú nna-ya, nwere.

25 Ndia bu kwa umu-ndikom Ana; Dishon, na Ọhọlibama nwa-nwayi Ana.

26 Ndia bu kwa umu-ndikom Dishon; Hemdan, na Eshban, na Itran, na Keran.

27 Ndia bu umu-ndikom Iza; Bilhan, na Zaavan, na Akan.

28 Ndia bu umu-ndikom Dishan; Uz, na Aran.

29 Ndia bu ndi-isi ndi Hoa; Lotan onye-isi, Shobal onye-isi, Zibeon onye-isi, Ana onye-isi,

30 Dishon onye-isi, Iza onye-isi, Dishan onye-isi: ndia bu ndi-isi ndi Hoa, dika ndi-isi-ha si di n’ala Sia.

31 Ndia bu eze ndi bu eze n’ala Edom, tutu eze ọ bula bu eze umu Israel.

32 Bela nwa Beoa bu eze n’Edom; aha obodo-ya bu Dinhaba.

33 Bela we nwua, Jobab nwa Zera, nke sitere na Bozra, we buru eze n’ọnọdu ya.

34 Jobab we nwua, Husham, nke sitere n’ala ndi Timan, we buru eze n’ọnọdu ya.

35 Husham we nwua, Hedad nwa Bedad, onye tib͕uru Midian n’ọhia Moab, we buru eze n’ọnọdu ya: aha obodo-ya bu Avit.

36 Hedad we nwua, Samla, nke sitere na Masrika, we buru eze n’ọnọdu ya.

37 Samla we nwua, Shaul, nke sitere na Rehobot n’usọ Osimiri, we buru eze n’ọnọdu ya.

38 Shaul we nwua, Beal-hanan nwa Akboa we buru eze n’ọnọdu ya.

39 Beal-hanan nwa Akboa we nwua, Heda we buru eze n’ọnọdu ya: aha obodo-ya bu Pau; aha nwunye-ya bu Mehetabel nwa Matred, bú nwa-nwayi Me-zahad.

40 Ndia bu kwa aha ndi-isi Isọ, dika ab͕uru nile ha si di, dika ebe nile si di, n’aha nile ha; Timna onye-isi, Alva onye-isi, Jetet onye-isi;

41 Ọhọlibama onye-isi, Ila onye-isi, Pinon onye-isi;

42 Kenaz onye-isi, Timan onye-isi, Mibza onye-isi;

43 Magdiel onye-isi, Iram onye-isi: ndia bu ndi-isi Edom, dika ebe-obibi-ha si di n’ala onwunwe-ha. Onye ahu bu Isọ nna Edom.

Categories
JENESIS

JENESIS 37

1 Jekob we biri n’ala ọnọdu-ọbìa nile nke nna-ya, n’ala Kenean.

2 Ndia bu osuso-ọmumu Jekob. Mb͕e Josef b͕ara arọ iri na asa, ọ nāzù ìgwè ewu na aturu, ya na umu-nne-ya; ya onwe-ya bu nání nwata, ya na umu Bilha na umu Zilpa, bú ndinyom nna-ya, yikọrọ zù ewu na aturu: Josef we wetara nna-ha akukọ ihe ọjọ ha.

3 Ma Israel huru Josef n’anya kari umu-ya nile, n’ihi na nwa agadi-ya ka ọ bu: o we mere ya uwe-nwuda nwere aka.

4 Umu-nne-ya we hu na ọ bu ya onwe-ya ka nna-ha huru n’anya kari umu-nne-ya nile; ha we kpọ ya asì, ha apughi kwa igwa ya okwu n’udo.

5 Josef we rọ nrọ, gosi ya umu-nne-ya: ha we kpọ ya asì ọzọ kari.

6 Ọ si ha, Biko, nurunu nrọ a nke m’rọworo:

7 ma, le, ayi onwe-ayi nēke ùkwù-ọka n’etiti ubi, ma, le, ùkwù-ọka nkem biliri, guzo kwa onwe-ya ọtọ; ma, le, ùkwù-ọka-unu nāb͕a gburugburu, kpọ isi ala nye ùkwù-ọka nkem.

8 Umu-nne-ya we si ya, Ì gābu eze-ayi n’ezie? ma-ọbu ì gāchi ayi n’ezie? Ha we kpọ ya asì ọzọ kari n’ihi nrọ-ya nile, na n’ihi okwu-ya nile.

9 Ọ we rọ kwa nrọ ọzọ, kọrọ ya umu-nne-ya, si, Le, arọwom nrọ ọzọ; ma, le, anyanwu na ọnwa na kpakpando iri na otù nākpọ isi ala nyem.

10 Ọ we kọrọ ya nna-ya, kọkwara umu-nne-ya; nna-ya we basiere ya nba ike, si ya, Gini bu nrọ a nke i rọworo? Mu onwem na nne-gi na umu-nne-gi, àyi gābia n’ezie ikpọ isi ala nye gi?

11 Umu-nne-ya we kwo ya ekworo; ma nna-ya debere okwu ahu.

12 Umu-nne ya we je izù ìgwè ewu na aturu nke nna-ha na Shekem.

13 Israel we si Josef, Umu-nne-gi, hà adighi-azù ewu na aturu na Shekem? bia, m’gēzì kwa gi jekuru ha. Ọ si ya, Lekwam.

14 Ọ si ya, Biko, je le ma umu-nne-gi nọ n’udo, ma ìgwè ewu na aturu di kwa n’udo; weghachikwaram okwu. O si na ndagwurugwu Hebron ziga ya, o we biarue Shekem.

15 Otù nwoke we hu ya, ma, le, ọ nāwaghari n’ọhia: nwoke ahu we jua ya, si, Gini ka i nāchọ?

16 Ọ si Umu-nnem ka m’nāchọ: biko, gosim ebe ha nāzù ewu na aturu.

17 Nwoke ahu we si, Ha esiwo n’ebe a bulie ije: n’ihi na anurum ka ha nāsi, K’ayi je Dotan. Josef we so umu-nne-ya, chọta ha na Dotan.

18 Ha we hu ya n’ebe di anya, ma tutu ọ biakute ha nso, ha b͕agide ya ìzù ọjọ ime ka ọ nwua.

19 Ha we sìrita onwe-ha, Le, ọ̀kà-nrọ a nābia.

20 Ma ub͕u a, bianu, ka ayi b͕ue ya, tubà ya n’otù nime olùlù ndia, ayi gāsi kwa, Ajọ anu eriwo ya: ayi gāhu kwa ihe nrọ-ya nile gābu.

21 Reuben we nu ya, naputa ya n’aka-ha, si, Ka ayi ghara itib͕u ya.

22 Reuben we si ha, Unu awusila ọbara; tubànu ya n’olùlù a nke di n’ọzara, ma unu esetila aka imegide ya: ka o we naputa ya n’aka-ha, ime ka ọ laghachikuru nna-ya.

23 O rue, mb͕e Josef biakutere umu-nne-ya, na ha yipuru Josef uwe-ya, bú uwe-nwuda ahu nwere aka nke di n’aru ya;

24 ha kuru ya, tubà ya n’olùlù ahu: ma olùlù ahu tọb͕ọrọ n’efu, miri adighi nime ya.

25 Ha we nọdu iri nri: ha we welie anya-ha, hu, ma, le usu-ije ndi Ishmael si na Gilead nābia, camel-ha nēbu kwa uda na balm na myrrh, nēje iweda ya n’Ijipt.

26 Juda we si umu-nne-ya, Ùrù gini di ya mb͕e ayi gēb͕u nwa-nne-ayi, zo ọbara-ya?

27 Bianu, ka ayi re ya nye ndi Ishmael ndia, aka-ayi adi-kwa-la n’aru ya; n’ihi na nwa-nne-ayi, bú anu-aru-ayi, ka ọ bu. Umu-nne-ya we nu olu-ya.

28 Ndi Midian, bú ndi-ahia, we gabiga; ha we sere Josef, si n’olùlù dọlite ya, re Josef nye ndi Ishmael n’orú nkpuru-ego ọla-ọcha. Ha we kubata Josef n’Ijipt.

29 Reuben we biaghachi n’olùlù ahu; ma, le, Josef anọghi n’olùlù ahu; ọ we dọwa uwe-ya nile.

30 O we laghachikuru umu-nne-ya, si, Nwata ahu anọghi; ma mu onwem, òle ebe mu onwem gēje?

31 Ha we chiri uwe Josef, b͕u kwa nkpi, biaye uwe ahu nime ọbara-ya,

32 ziga uwe-nwuda ahu nwere aka, chita ya nye nna-ha, si, Nka ka ayi hutaworo: biko, mata ma uwe nwa-gi ka ọ bu ma-ọbu na ọ bughi ya.

33 Ọ we mata ya, si, Ọ bu uwe nwam; ajọ anu eriwo ya; anu-ọhia adọb͕uwo Josef n’ezie.

34 Jekob we dọwa uwe-nb͕okwasi-ya nile, yiri ákwà-nkpe n’úkwù-ya, ruru nwa-ya újú ọtutu ubọchi.

35 Umu-ya ndikom nile na umu-ya ndinyom nile we bilie ikasi ya obi; ma ọ juru, na agaghi-akasi ya obi; ọ si, N’ihi na m’gāridakuru nwam rue ala-mọ nēru újú. Nna-ya we kwara ya ákwá.

36 Ndi Midian we rerue ya Ijipt nye Potifa, onye nējere Fero ozi, onye-isi nke ndi-ob͕ū.

Categories
JENESIS

JENESIS 38

1 O rue, na mb͕e ahu, na Juda siri n’ebe umu-nne-ya nọ rida, si n’ije-ya wezuga onwe-ya ba n’ulo otù nwoke, bú onye Adulam, onye aha-ya bu Haira.

2 Juda we hu n’ebe ahu nwa-nwayi nke otù nwoke, bú onye Kenean, nke aha-ya bu Shua; ọ we kuru ya, bakuru ya.

3 Ọ we turu ime, mua nwa-nwoke; Juda we kpọ aha-ya Ia.

4 Ọ we turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Onan.

5 Ọ we mu kwa nwa-nwoke ọzọ, kpọ aha-ya Shila: ma Juda nọ na Kezib mb͕e ọ muru ya.

6 Juda we lutara Ia ọkpara-ya nwunye, nke aha-ya bu Tema.

7 Ma Ia, bú ọkpara Juda, jorọ njọ n’anya Jehova, Jehova we me ka ọ nwua.

8 Juda we si Onan, Bakuru nwunye nwa-nne-gi, we luara ya ọlu nwa-nne di, me ka nkpuru tolitere nwa-nne-gi.

9 Ma Onan mara na ọ bughi ya gēnwe nkpuru ahu; o we rue, na mb͕e ọ bula ọ bakuru nwunye nwa-nne-ya, na ọ wusiri ya n’ala, ka ọ we ghara inye nwa-nne-ya nkpuru.

10 Ma ihe ọ mere jọrọ njọ n’anya Jehova; O we me ka ọ nwu kwa.

11 Juda we si Tema, bú nwunye nwa-ya, Nọdu n’ọnọdu nwayi di-ya nwuru n’ulo nna-gi, rue mb͕e Shila, bú nwam, gētozù: n’ihi na ọ siri, Ka ya onwe-ya we ghara inwu kwa, dika umu-nne-ya. Tema we je nọdu n’ulo nna-ya.

12 Ubọchi gabigara we di ọtutu, nwa-nwayi Shua, bú nwunye Juda, we nwua; ewe kasie Juda obi, o we rigokuru ndi nākpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya rue Timna, ya onwe-ya na Haira, bú enyì-ya, bú onye Adulam ahu.

13 Ewe gosi Tema, si, Le, nna di-gi nārigoru Timna ikpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya.

14 O we chipu n’aru ya uwe ọnọdu nwayi di-ya nwuru nke ya, were ákwà-nkpudo-ya kpuchie onwe-ya, fuchi onwe-ya, nọdu n’onu-uzọ Enaim, nke di n’uzọ Timna; n’ihi na ọ huru na Shila etozuwori, ma eweghi ya onwe-ya nye ya na nwunye.

15 Juda we hu ya, che na ọ bu nwayi nākwa iko; n’ihi na o kpuchiri iru-ya.

16 O we si n’ije-ya wezuga onwe-ya jekuru ya n’uzọ, si, Biko, ngwa, ka m’bakuru gi: n’ihi na ọ maghi na nwunye nwa-ya ka ọ bu. Tema we si, Gini ka i gēnyem, ka i we bakurum?

17 Ọ si, Mu onwem gēzitere gi nwa-ewu sitere n’ìgwè ewu na aturu. Tema we si, Ì gēnyem ihe-ibe, rue mb͕e i gēzite ya?

18 Ọ si, Gini bu ihe-ibe nke m’gēnye gi? Tema we si, Nb͕a-aka-akàrà-gi na eriri mma gi, na nkpa-n’aka-gi nke di n’aka-gi. Ọ chiri ha nye ya, we bakuru ya, o we turu ime n’aka-ya.

19 Tema we bilie, la, chipu ákwà-nkpudo-ya n’aru ya, yiri uwe ọnọdu nwayi di-ya nwuru nke ya.

20 Juda we zìe nwa-ewu ahu n’aka enyì-ya, bú onye Adulam, inara ihe-ibe ahu n’aka nwayi ahu: ma ọ chọtaghi ya.

21 O we jua ndikom nke ebe-ya, si, Òle ebe nwayi ahu edoro nsọ ikwa iko nọ, bú nwayi ahu nke nọduru n’Enaim n’uzọ? Ha si, Ọ dighi nwayi edoro nsọ ikwa iko nọworo n’ebe a.

22 Ọ we laghachikute Juda, si, Achọtaghm ya; ọzọ kwa, ndikom ebe ahu siri, Ọ dighi nwayi edoro nsọ ikwa iko nọworo n’ebe a.

23 Juda we si, Ka o were ya n’onwe-ya, ka ayi we ghara ighọ ihe ileda anya: le, ezigaram nwa-ewu a, ma gi onwe-gi achọtaghi ya.

24 O rue, mb͕e ihe ra ka ọnwa atọ gasiri, na egosiri Juda, si, Tema, bú nwunye nwa-gi, akwawo iko; ọzọ kwa, le, ọ di ime site n’ikwa-iko. Juda we si, Me ka ọ puta, ka esure ya ọku.

25 Mb͕e anēme ka nwayi ahu puta, ya onwe-ya zigara nna di-ya ozi, si, Site n’aka nwoke nke nwe ihe ndia ka mu onwem di ime: ọ si kwa, Biko, mata onye nwe ihe ndia, bú nb͕a-aka-akàrà, na eriri-nma, na nkpa-n’aka.

26 Juda we mata ha, ọ si, Ọ bu onye ezi omume kari mu onwem; n’ihi na eweghm ya nye Shila, bú nwam. Ma ọ maghi kwa ya ọzọ ma-ọli.

27 O rue na, nime mb͕e ọmumu-nwa-ya, le, umu abua di n’afọ-ya.

28 O rue, n’ọmumu-nwa-ya, na otù setipuru aka: nwayi nke nēle ime anya we were ogho uhie ke n aka-ya, si, Nka buru uzọ puta.

29 O rue na, ka ọ nēseghachi aka-ya, le, nwa-nne-ya nwoke putara: nwayi ahu we si, Gini mere i ji tiwara onwe-gi ntiwa? ewe kpọ aha-ya Perez.

30 Emesia nwa-nne-ya nwoke putara, bú nke nwere ogho uhie n’aka-ya: ewe kpọ aha-ya Zera.

Categories
JENESIS

JENESIS 39

1 Ma emere ka Josef ridata n’Ijipt: Potifa, onye nējere Fero ozi, onye-isi nke ndi-ob͕ū, bú nwoke Ijipt, we b͕a ya n’aka ndi Ishmael, ndi mere ya ka ọ ridata n’ebe ahu.

2 Jehova we nọyere Josef, ọ we buru nwoke ihe nāgara nke-ọma; ọ nọ n’ulo onye-nwe-ya, bú onye Ijipt ahu.

3 Onye-nwe-ya we hu na Jehova nọyere ya, ọ hu kwa na ihe nile nke ya nēme, Jehova nēme ka ọ ga nke-ọma n’aka-ya.

4 Josef we huta amara n’iru ya, we jere ya ozi: ọ me ya onye nēlekọta ulo-ya anya, ọ bu kwa ihe nile o nwere ka o tiyere n’aka-ya.

5 O rue, site na mb͕e o mere ya onye-nlekọta n’ulo-ya na onye nēlekọta ihe nile ọ nwere, na Jehova gọziri ulo onye Ijipt ahu n’ihi Josef; ngọzi Jehova we dikwasi ihe nile o nwere, n’ulo na n’ọhia.

6 O we rapu ihe nile o nwere n’aka Josef; ọ maghi kwa ihe ọ bula di n’aka ya, ma-ọbughi nání nri nke ya onwe-ya nēri. Josef makwara mma n’aru, ma kwa mma ile anya.

7 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na nwunye nke onye-nwe-ya weliri anya-ya abua lekwasi Josef, si, Ka mu na gi dina.

8 Ma ọ juru, si nwunye nke onye-nwe-ya, Le, onye-nwem amaghi ihe di n’akam n’ulo, ọ bu kwa ihe nile o nwere ka o tiyeworo n’akam;

9 ọ dighi uku n’ulo a kari mu onwem; o b͕ochighi kwa ihe ọ bula n’ebe m’nọ ma-ọbughi nání gi, n’ihi na gi onwe-gi bu nwunye-ya: m’gēsi kwa aṅa me oké ihe ọjọ nka, mehie megide Chineke?

10 O rue, mb͕e ọ nāgwa Josef okwu kwa-ubọchi, na ọ geghi ya nti, idina nso ya, ma-ọbu inọyere ya.

11 O rue, dika ubọchi ahu, na ọ bara n’ulo ije ozi-ya; ma ọ dighi onye n’etiti ndikom nke ulo ahu nọ n’ebe ahu n’ulo.

12 Nwayi ahu we jide ya n’uwe-ya, si, Ka mu na gi dina; o we rapu uwe-ya n’aka-ya, b͕alaga, pua n’èzí.

13 O rue, mb͕e nwayi ahu huru na ọ rapururi uwe-ya n’aka-ya, b͕apu n’èzí,

14 na ọ kpọrọ ndikom ulo-ya, gwa ha okwu, si, Lenu, o mewo ka nwoke. Hibru bakute ayi ikwa ayi emò; ọ bakuterem idina-yerem, m’we kpọ nkpu n’oké olu:

15 o rue, mb͕e ọ nuru na ewelirim olum kpọ nkpu, na ọ rapuru uwe-ya n’ebe m’nọ, b͕alaga, pua n’èzí.

16 Nwayi ahu we debe uwe-ya n’ebe ọ nọ, rue mb͕e onye-nwe-ya batara n’ulo-ya.

17 Ọ we gwa ya dika okwu ndia si di, si, Orù Hibru ahu, nke i meworo ka ọ bakute ayi, bakuterem ikwam emò:

18 ma o rue, mb͕e m’weliri olum kpọ nkpu, na ọ rapuru uwe-ya n’ebe m’nọ, b͕apu n’ezí.

19 O rue, mb͕e onye-nwe-ya nuru okwu nile nke nwunye-ya, nke ọ gwara ya, si, Dika ihe ndia si di ka orù-gi merem; na iwe-ya di ọku.

20 Onye-nwe Josef we kuru ya, tiye ya n’ulo-nkpọrọ, bú ebe ndi-nkpọrọ nke eze Ijipt nọ n’ab͕u: o we nọ n’ebe ahu n’ulo-nkpọrọ.

21 Ma Jehova nọyere Josef, me ka ebere-Ya rue ya aru, O nye ya amara n’iru onye-isi ulo-nkpọrọ ahu.

22 Onye-isi ulo-nkpọrọ ahu we tiye n’aka Josef ndi-nkpọrọ nile ndi nọ n’ulo-nkpọrọ ahu; ihe ọ bula ha nēme kwa n’ebe ahu, ya onwe-ya bu onye nēme ya.

23 Ọ dighi ihe ọ bula onye-isi ulo-nkpọrọ ahu nāhu nke di n’aka-ya, n’ihi na Jehova nọyere ya; ihe nke ya onwe-ya nēme, Jehova mere ka ọ ga nke-ọma.

Categories
JENESIS

JENESIS 40

1 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na obu-ihe-ọṅuṅu nke eze Ijipt na osi-ite-ya mehiere megide onye-nwe-ha, bú eze Ijipt.

2 Fero we we iwe megide madu abua ahu nējere ya ozi, megide onye-isi-ndi-obu-ihe-ọṅuṅu, megide kwa onye-isi ndi-osi-ite.

3 Ọ we tiye ha n’ebe anēdebe ndi-nkpọrọ n’ulo onye-isi ndi-ob͕ū, nime ulo-nkpọrọ, bú ebe Josef nọ n’ab͕u.

4 Onye-isi ndi-ob͕ū we me ka Josef nēlekọta ha anya, ọ we jere ha ozi: ha nọ ubọchi ufọdu n’ebe anēdebe ndi-nkpọrọ.

5 Ha we rọ nrọ, ha abua, onye ọ bula ọ rọ nrọ-ya n’otù abali ahu, onye ọ bula dika akukọ-isi nrọ-ya si di, bú obu-ihe-ọṅuṅu na osi-ite eze Ijipt nwere, ndi nọ n’ab͕u n’ulo-nkpọrọ.

6 Josef we bakute ha n’ututu, hu ha, ma, le, iru nāb͕aru ha.

7 Ọ we jua ndi ahu nējere Fero ozi, ndi nọyere ya n’ebe anēdebe ndi-nkpọrọ n’ulo onye-nwe-ya, si, Gini mere iru-unu ji jọ njọ taa?

8 Ha si ya, Nrọ ka ayi rọworo, ọ dighi kwa onye nākọ isi-ya. Josef we si ha, Ọ̀ bughi Chineke nwe akukọ-isi nrọ nile? biko, kọrọnu m.

9 Onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu ahu we kọrọ Josef nrọ-ya, si ya, Na nrọm, le, osisi vine di n’irum.

10 alaka atọ di kwa n’osisi vine ahu: vine ahu we di ka ọ nāma ifuru, okoko-ya nile b͕ọwara; uyọkọ-ya nile miri nkpuru-vine chara acha:

11 iko Fero di kwa n’akam; m’were nkpuru-vine ahu, pinye ha n’iko Fero, nye iko ahu n’aka Fero.

12 Josef we si ya, Nka bu akukọ-isi-ya: alaka atọ ahu, ubọchi atọ ka ha bu;

13 ọ fọduru ubọchi atọ Fero gēweli isi-gi, me ka i lata n’ọnọdu-gi: i gēnye kwa iko Fero n’aka-ya, dika i nēme na mbu mb͕e i buri obu-ihe-ọṅuṅu-ya.

14 Ma otú ọ di chetam n’onwe-gi mb͕e ọ gādiri gi nma, mekwara m ebere, biko, chetakwa m n’iru Fero, me ka m’si n’ulo a pua:

15 n’ihi na ezupurum n’ala ndi-Hibru n’ezie: ọzọ kwa, n’ebe a emeghm ihe ọ bula ka ha we tinye m n’olùlù a.

16 Onye-isi ndi-osi-ite we hu na akukọ-isi nrọ a di nma, ọ we si Josef, Mu onwem di kwa na nrọm, ma, le, nkata atọ nke achicha ọcha di n’isim:

17 ufọdu nime ihe-oriri nile nke Fero nke osi ite nēsi di kwa na nkata nke kachasi elu; anu-ufe nēri kwa ha site na nkata ahu n’elu isim.

18 Josef we za, si, Nka bu akukọ-isi-ya: nkata atọ ahu, ubọchi atọ ka ha bu;

19 ọ fọduru ubọchi atọ Fero gēweli isi-gi wepu ya n’aru gi, kwuba gi n’elu osisi; anu-ufe gēri kwa anu-aru-gi site n’aru gi.

20 O rue, n’ubọchi nke-atọ, nke bu ubọchi ncheta ọmumu Fero, na o mere oké oriri nye ndi-orù-ya nile: o welie isi onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu na isi onye-isi ndi-osi-ite n’etiti ndi-orù-ya.

21 O me ka onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu lata n’ọnọdu-obu-ihe-ọṅuṅu-ya; o we nye iko n’aka Fero:

22 ma ọ kwubara onye-isi ndi-osi-ite: dika Josef kọrọ isi nrọ nye ha.

23 Ma onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu echetaghi Josef, kama o chezọrọ ya.