Categories
JENESIS

JENESIS 21

1 Jehova we leta Sera dika Ọ siri, Jehova we me Sera dika O kwuru.

2 Sera we turu ime, muara Abraham nwa-nwoke n’agadi-ya, na mb͕e ahu akara àkà nke Chineke kpayere Abraham uka bayere ya.

3 Abraham we kpọ aha nwa-ya nwoke nke amuru nye ya, onye Sera muru nye ya, Aisak.

4 Abraham we bìe nwa-ya nwoke, bú Aisak, úgwù mb͕e o ruru ubọchi asatọ, dika Jehova nyere ya iwu.

5 Abraham b͕ara ọgu arọ ise, mb͕e amuru ya Aisak, bú nwa-ya nwoke.

6 Sera we si, Ichì-ọchì ka Chineke doziworom; onye ọ bula nke nānu ya gāchì ọchì bayerem.

7 Ọ si kwa, Ònye gāsiwori Abraham, Sera gēnye umu ara? n’ihi na amuworom ya nwa-nwoke n’agadi-ya.

8 Nwa ahu we tó etó, eme ka ọ rapu ara: Abraham we me oké oriri di uku n’ubọchi emere ka Aisak rapu ara.

9 Sera we hu nwa-nwoke Hega, bú nwayi Ijipt, nke ọ mururi Abraham, ka ọ nāchì ọchì nke-uku.

10 Ọ we si Abraham, Chupu orù-nwayi a na nwa-ya nwoke: n’ihi na nwa-nwoke orù-nwayi a agaghi-eso nwam nwoke, bú Aisak, nweta ihe-gi.

11 Ma ihe ahu jọrọ njọ nke-uku n’anya Abraham n’ihi nwa-ya nwoke.

12 Chineke we si Abraham, Ka ọ ghara ijọ njọ n’anya-gi n’ihi nwa-okoro a, na n’ihi orù-gi nwayi: ihe nile Sera nāsi gi me, ge nti n’olu-ya; n’ihi na ọ bu nime Aisak ka agākpọrọ gi nkpuru.

13 Ọzọ kwa, nwa orù-nwayi ahu ka M’gēme ka ọ ghọ mba, n’ihi na nkpuru-gi ka ọ bu.

14 Abraham we bilie n’isi-ututu, were achicha na karama-akpukpọ miri nye Hega, tukwasi ya n’ubu-ya, ọ nye kwa ya nwa-ya, zilaga ya: ọ we je, nāwaghari n’ọzara Bia-sheba.

15 Miri we gwu na karama-akpukpọ ahu, ọ we tuda nwa ahu n’okpuru otù nime osisi ntà,

16 je, nọdu ala n’onwe-ya na ncherita-iru ya n’ebe di anya, dika ndi nāb͕a uta gāb͕aru; n’ihi na ọ siri, Ka m’ghara ilekwasi ọnwu nwam anya. Ọ we nọdu na ncherita-iru ya, welie olu-ya, kwa ákwá.

17 Chineke we nu olu nwa-okoro ahu; mọ-ozi nke Chineke we si n’elu-igwe kpọ Hega òkù, si ya, Gini nēme gi, Hega? atula egwu; n’ihi na Chineke anuwo olu nwa-okoro ahu n’ebe ọ nọ.

18 Bilie, palie nwa-okoro ahu, jide ya n’aka-gi; n’ihi na mba uku ka M’gēme ya ka ọ ghọ.

19 Chineke we meghe anya-ya abua, ọ hu olùlù-miri; ọ we je, b͕ajue karama-akpukpọ-ya na miri, me ka nwa-okoro ahu ṅua.

20 Chineke we nọyere nwa-okoro ahu, ọ we tó etó, biri n’ọzara, ghọ ọ̀kà-uta, ka o nētó etó.

21 O biri n’ọzara Peran: nne-ya we si n’ala Ijipt lutara ya nwunye.

22 O rue na mb͕e ahu, na Abimelek na Faikol, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya, gwara Abraham okwu, si, Chineke nọyere gi n’ihe nile nke gi onwe-gi nēme:

23 ma ub͕u a were Chineke ṅuaram iyi n’ebe a na i gaghi-agwa mu onwem, ma-ọbu umum, ma-ọbu umu umum, okwu-ugha: ọ bu dika ebere nke m’meworo gi si di ka i gēmerem, mekwaram ala nke i nọworo dika ọbìa nime ya.

24 Abraham we si, Mu onwem gāṅu iyi.

25 Abraham we bara Abi-melek mba n’ihi olùlù-miri nke ndi-orù Abimelek napuru ya-ri n’ike.

26 Abi-melek we si, Amaghm onye mere ihe a: ọzọ kwa, gi onwe-gi, i gosighm, ma mu onwem kwa, anughm ya, ma-ọbughi nání taa.

27 Abraham we chiri ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi nye Abimelek; ha abua we b͕a ndu.

28 Abraham we debe umu-nne-aturu asa n’onwe-ha iche, bú nke ìgwè ewu na aturu.

29 Abimelek we si Abraham, Gini ka umu-nne-aturu asa ndia nke i debere n’onwe-ha iche bu?

30 Ọ we si, Umu-nne-aturu asa ndia ka i gānara n’akam, ka ọ we ghọrọm ihe-àmà na m’gwuru olùlù-miri a.

31 N’ihi ya ọ kpọrọ ebe ahu Bia-sheba; n’ihi na n’ebe ahu ka ha abua ṅuru iyi.

32 Ha we b͕a ndu na Bia-sheba: Abimelek we bilie, ya na Faikol, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya, ha laghachi n’ala ndi Filistia.

33 Abraham we kua osisi tamarisk na Bia-sheba, kpọkue aha Jehova, bú Chineke Ebighi-ebi, n’ebe ahu.

34 Abraham we nọ dika ọbìa n’ala ndi Filistia ọtutu ubọchi.

Categories
JENESIS

JENESIS 22

1 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na Chineke nwara Abraham, si ya, Abraham; ọ si, Lekwam.

2 Ọ si, Biko, were nwa-gi nwoke nke i nwere nání ya, onye i huru n’anya, bú Aisak, je ala Moraia; sure ya n’ebe ahu, ka ọ buru àjà-nsure-ọku, n’elu otù nime ugwu ahu nke M’gāsi gi je.

3 Abraham we bilie n’isi-ututu, jikwa inyinya-ibu-ya, chiri madu abua nime umu-okorọbia-ya tiyere onwe-ya, na Aisak, bú nwa-ya nwoke; ọ kpọwa nkú nke àjà-nsure-ọku, bilie, je ebe ahu nke Chineke siri ya-ri je.

4 N’ubọchi nke-atọ Abraham weliri anya-ya abua, hu ebe ahu n’ebe di anya.

5 Abraham we si umu-okorọbia-ya, Nọdunu ebe a n’onwe-unu, unu na inyinya-ibu, ma mu onwem na nwa-okoro a gēje ebe ahu; ayi gākpọ kwa isi ala, chigharikute unu.

6 Abraham we were nkú àjà-nsure-ọku, bo Aisak nwa-ya nwoke; o jide n’aka-ya ọku na mma; ha abua we yikọ je.

7 Aisak we gwa Abraham, bú nna-ya, okwu, si, Nnam; ọ si, Lekwam, nwam. Ọ si, Le, ọku na nkú: ma òle ebe nwa-aturu iji chu aja-nsure-ọku di?

8 Abraham we si, Chineke gāhuru Onwe-ya nwa-aturu iji chu aja-nsure-ọku, nwam: ha abua we yikọ je.

9 Ha biarue ebe ahu nke Chineke siri ya-ri je; Abraham we wue ebe-ichu-aja n’ebe ahu, do nkú ahu n’usoro, ke Aisak, bú nwa-ya nwoke, ab͕ú, tukwasi ya n’elu ebe-ichu-àjà, n’elu nku.

10 Abraham we setia aka-ya, were mma ahu ib͕u nwa-ya nwoke.

11 Ma mọ-ozi nke Jehova siri n’elu-igwe kpọ ya òkù, si, Abraham, Abraham: ọ si, Lekwam.

12 Ọ si, Esetila aka-gi tukwasi n’aru nwa-okoro ahu, eme-kwa-la ya ihe ọ bula: n’ihi na ub͕u a ka M’mara na onye nātu egwu Chineke ka i bu, n’ihi na i b͕ochighi nwa-gi nwoke, nke i nwere nání ya, iwere ya nyem.

13 Abraham we welie anya-ya abua hu, ma, le, otù ebulu n’azu ya, nke alughi-ulù nējide ya na mpi-ya: Abraham we je, were ebulu ahu, sure ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku n’ọnọdu nwa-ya nwoke.

14 Abraham we kpọ aha ebe ahu Jehova-Jaire: dika anāsi rue taa, N’ugwu nke Jehova ka agāhu ya.

15 Mọ-ozi nke Jehova we si n’elu-igwe kpọ Abraham òkù nke ub͕ò abua,

16 si, Ejim Onwem ṅu iyi, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta, na n’ihi na i mewo ihe a, n’ihi na i b͕ochighi kwa nwa-gi nwoke, onye i nwere nání ya:

17 na n’igọzi M’gāgọzi gi, n’ime ka aba uba M’gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, na dika ájá nke di n’usọ oké osimiri; nkpuru-gi gēnweta kwa ọnu-uzọ-ama nke ndiroya;

18 ọ bu kwa na nkpuru-gi ka mba nile nke uwa gāgọzi onwe-ha; n’ihi na i gewo nti n’olum.

19 Abraham we chigharikute umu-okorọbia-ya, ha bilie, yikọ je Bia-sheba; Abraham we biri na Bia-sheba.

20 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na egosiri Abraham, si, Le, Milka, ya onwe-ya amuwo-kwa-ra nwa-nne-gi nwoke, bú Nehoa, umu-ndikom;

21 Uz, bú ọkpara-ya, na Buz, bú nwa-nne-ya, na Kemuel, bú nna Eram

22 na Kesed, na Hazo, na Pildash, na Jidlaf, na Betuel.

23 Betuel we mua Rebeka: madu asatọ ndia ka Milka muru nye Nehoa, bú nwa-nne Abraham.

24 Iko-ya nwayi, onye aha-ya bu Reuma, ya onwe-ya mu-kwa-ra Tiba, na Gaham, na Tahash, na Meaka.

Categories
JENESIS

JENESIS 23

1 Ndu Sera we buru ọgu arọ isi na asa: ndia bu arọ ndu Sera.

2 Sera we nwua na Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron), n’ala Kenean: Abraham we bia itiri Sera aka n’obi, na ikwara ya ákwá.

3 Abraham we si n’iru onye nke ya nwuru anwu bilie, gwa umu Het okwu, si,

4 Ọbìa na onye-nnọdu ka m’bu n’etiti unu: nyenum ihe-onwunwe, bú ala-ílì, n’etiti unu, ka m’we lìpu ya n’anyam, bú onye-nkem nwuru anwu.

5 Umu Het we za Abraham, si ya,

6 Nuru olu-ayi, onye-nwem: onye-isi nke Chineke ka i bu n’etiti ayi: lìe onye-nke-gi nwuru anwu n’ílì ahu nke kachasi nma n’ílì-ayi nile; ọ dighi onye nime ayi gēb͕ochiri gi ílì-ya ka i ghara ilì onye-nke-gi nwuru anwu

7 Abraham we bilie, kpọ isi ala nye ndi ala ahu, bú umu Het.

8 Ọ we kpayere ha uka, si, Ọ buru na ọ di na nkpuru-obi-unu ilìpu ya n’anyam, bú onye-nkem nwuru anwu, nurunu olum, riọkwara m Efron nwa Zoha,

9 ka ọ we nyem ọb͕à Makpila, nke ọ nwere, nke di n’isi nke ọhia-ya n’ego zuru ezu o ruru ka ọ gēnyem ya n’etiti unu ka ọ buru ihe-onwunwe, nke gābu ala-ílì.

10 Ma Efron nānọdu n’etiti umu Het: Efron onye Het we za Abraham na nti umu Het, bú ndi nile nābà n’ọnu-uzọ-ama obodo-ya, si,

11 E-è, onye-nwem, nuru olum: ọhia ahu ka m’nyeworo gi, na ọb͕à ahu nke di nime ya, gi ka m’nye-woro ya; n’anya umu ndi nkem ka m’nyeworo gi ya: lìe onye-nke-gi nwuru anwu.

12 Abraham we kpọ isi ala n’iru ndi ala ahu.

13 Ọ gwa Efron okwu na nti ndi ala ahu, si, Kama, ọ buru na gi onwe-gi kwere, biko, nuru olum: enyewom ego ọhia ahu; naram ya, ka m’we lìe onye-nkem nwuru anwu n’ebe ahu.

14 Efron we za Abraham, si ya,

15 Onye-nwem, nuru olum: ala nke ruru nnù shekel ọla-ọcha, ǹke ahu bu gini n’etiti mu na gi? lì kwa onye-nke-gi nwuru anwu.

16 Abraham we ge Efron nti; Abraham we tùara Efron ọla-ọcha ahu, nke o kwuru na nti umu Het, nnù shekel ọla-ọcha nke ndi-ahia gānara.

17 Ọhia Efron, nke di nime Makpila, nke di n’iru Mamre, ọhia ahu, na ọb͕à ahu nke di nime ya, na osisi nile nke di n’ọhia ahu, nke di n’ókè-ala ya nile gburugburu, ewe me ha ka ha guzosiere Abraham ike

18 ibu ihe-nzuta n’anya umu Het, n’etiti ndi nile nābà n’ọnu-uzọ-ama obodo-ya.

19 Emesia Abraham lìri Sera, bú nwunye-ya, n’ọb͕à ọhia Makpila ahu n’iru Mamre (nke ahu bu Hebron), n’ala Kenean.

20 Umu Het we me ọhia ahu na ọb͕à nke di nime ya ka ha guzosiere Abraham ike ibu ihe-onwunwe nke gābu ala-ílì.

Categories
JENESIS

JENESIS 24

1 Ma Abraham ghọrọ agadi, ubochi nduya nāgwu: Jehova gọzikwarari Abraham n’ihe nile.

2 Abraham we si orù-ya, bú okenye nke ulo-ya, onye nāchi ihe nile o nwere, Biko, tiye aka-gi n’okpuru apata-ukwum:

3 m’gēme kwa gi ka i were Jehova, bú Chineke nke elu-igwe na Chineke nke uwa, ṅu iyi, na i gaghi-alutara nwam nwunye sitere n’umu-ndinyom nke ndi Kenean, ndi mu onwem bi n’etiti ha:

4 kama ọ bu alam na umu-nnam ka i gējekuru, lutara nwam, bú Aisak, nwunye.

5 Orù ahu we si ya, Eleghi anya nwayi ahu agaghi-achọ isom jerue ala nka: ọ̀ bu na m’nāghaghi ime ka nwa-gi laghachi n’ala ahu nke i siri n’ebe ahu puta?

6 Abraham we si ya, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ime ka nwam laghachi n’ebe ahu.

7 Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, Nke si n’ulo nnam, na n’ala amurum, kuputam, Nke gwakwara m okwu, Nke ṅukwara m iyi, si, Nkpuru-gi ka M’gēnye ala nka; Ya onwe-ya gēziga mọ-ozi-Ya n’iru gi, i gēsi kwa n’ebe ahu lutara nwam nwunye.

8 Ma ọ buru na nwayi ahu achọghi iso gi je, ya bu i puwo n’iyi nka i ṅurum; nání na i gaghi-eme ka nwam laghachi n’ebe ahu.

9 Orù ahu we tiye aka-ya n’okpuru apata-ukwu Abraham onye-nwe-ya, ṅuara ya iyi bayere okwu a.

10 Orù ahu we chiri kamel iri, nime kamel nile nke onye-nwe-ya, je; ezi ihe nile nke onye-nwe-ya di kwa n’aka-ya: o bilie, je Mesọpọtemia, rue obodo Nehoa.

11 Ọ me ka camel nile b͕ue ikpere n’ala n’azu obodo ahu n’akuku olùlù-miri na mb͕e anyasi, na mb͕e ndinyom ndi nēsere miri nāputa.

12 Ọ si, Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, biko, me ka o zutem taa, bú ihe m’nāchọ, mekwara onye-nwem Abraham ebere.

13 Le, mu onwem nēguzo n’akuku isi-iyi miri a; umu-ndinyom nke ndi obodo a nāputa kwa isere miri:

14 ka o ru kwa, na nwa-ab͕ọghọ ahu onye m’gāsi, Biko, zie ite-gi ka m’ṅua; onye gāsi kwa, Ṅua, ọzọ kwa, camel-gi ka m’gēme ka ha ṅua: ka ọ buru nwayi ahu ka I rọputaworo nye orù-gi, bú Aisak; ọ bu kwa nime nka ka m’gāmara na I meworo onye-nwem ebere.

15 O rue na, tutu o kwusia okwu, le, Rebeka nāputa, bú nwayi amuru nye Betuel nwa-nwoke Milka, bú nwunye Nehoa, nwa-nne Abraham, ite-ya di kwa n’ubu-ya.

16 Nwa-ab͕ọghọ ahu di nma nke-uku ile anya, nwayi nke akāmaghi nwoke, nwoke amaghi kwa aru-ya: ọ rida n’isi-iyi ahu, b͕ajue ite-ya, rigota.

17 Orù ahu we b͕a ọsọ izute ya, si, Biko, kwe ka m’ṅua nwantī miri site n’ite-gi.

18 Ọ si, Nua, onye-nwem: ọ me ngwa, zie ite-ya n’aka-ya, me ka ọ ṅua.

19 Mb͕e ọ mesiri ka ọ ṅua, nwayi ahu siri, Kamel gi ka m’gēsere kwa miri, rue mb͕e ha gāṅujuwori.

20 Ọ me ngwa, b͕apu miri di n’ite-ya nime ihe anu-ulo ji aṅu miri, ọ b͕a ọsọ ọzọ rue olùlù-miri isere miri, we sere nye camel-ya nile.

21 Nwoke ahu nēlegide ya anya, nāb͕a nkiti, imara ma Jehova mereri ka ije-ya ga nke-ọma, ma-ọbu na O meghi.

22 O rue, mb͕e camel ṅujusiri miri, na nwoke ahu were nb͕a-aka ọla-edo, nke ọtùtù-ya bu nkera shekel, na ọla-aka abua ib͕a n’aka-ya abua nke ọtùtù-ha bu shekel ọla-edo iri;

23 ọ si, Ǹwa onye ka i bu? biko, gosim. Ọ̀ di ọnọdu n’ulo nna-gi ayi gēnwe inọ ọnọdu-abali?

24 Nwayi ahu we si ya, Nwa Betuel ka m’bu, bú nwa Milka, nke ọ muru nye Nehoa.

25 Ọ sikwara ya, Ma okporo-ọka ma nri-anu-ulo riri nne n’ulo-ayi, ebe inọ ọnọdu-abali di kwa.

26 Nwoke ahu we rube isi, kpọ isi ala nye Jehova,

27 si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, bu, Onye nārapughi ebere-Ya na ezi-okwu-Ya n’ebe onye-nwem nọ: mu onwem, n’uzọ ka Jehova duworom rue ulo umu-nne onye-nwem.

28 Nwa-ab͕ọghọ ahu we b͕a ọsọ, gosi ulo nne-ya dika okwu ndia si di.

29 Ma Rebeka nwere nwa-nne nwoke, nke aha-ya bu Leban: Leban we b͕akuru nwoke ahu n’èzí, rue isi-iyi ahu.

30 O rue, mb͕e ọ huru nb͕a-aka ahu, na ọla-aka abua di n’aka nwa-nne-ya nwayi, mb͕e ọ nukwara okwu nile nke Rebeka nwa-nne-ya nwayi, si, Otú a ka nwoke ahu gwaram; na o biakutere nwoke ahu; ma, le, o nēguzo n’akuku camel-ya n’akuku isi-iyi ahu.

31 O we si, Bata, gi onye agọziri agọzi nke Jehova; n’ìhi gini ka i nēguzo n’èzí? n’ihi na mu onwem edoziwo ulo, na ebe camel-i gānọ.

32 Nwoke ahu we ba n’ulo, ọ tọpu ibu camel-ya; ọ nye ya okporo-ọka na nri-anu-ulo inye camel-ya, na miri isa ukwu-ya na ukwu ndikom ndi ya na ha yikọrọ bia.

33 Ewe dọba nri n’iru ya iri: ma ọ siri, M’gaghi-eri, rue mb͕e m’gēkwuwori okwum nile. Ọ si, Kwue.

34 Ọ si, Orù Abraham ka m’bu.

35 Jehova agọziwo kwa onye-nwem nke-uku; o we di uku: O nyewo kwa ya ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, na ọla-ọcha na ọla-edo, na orù-ndikom na ndinyom nēje ozi, na camel na inyinya-ibu di ọtutu.

36 Sera, bú nwunye nke onye-nwem, we muara onye-nwem nwa-nwoke mb͕e ọ ghọsiri agadi: o we nye ya ihe nile o nwere.

37 Onye-nwem we me ka m’ṅua iyi, si, I gaghi-alutara nwam nwunye sitere n’umu-ndinyom nke ndi Kenean, ndi mu onwem bi n’ala-ha:

38 kama ọ bu ulo nnam ka i gējekuru, jekuru ab͕urum, lutara nwam nwunye.

39 M’we si onye-nwem, Eleghi anya nwayi ahu agaghi-esom je.

40 Ọ sim, Jehova, Onye m’jeghariworo n’iru Ya, gēziga mọ-ozi-Ya ka gi na ya yikọ je, Ọ gēme kwa ka ije-gi ga nke-ọma; i gāluta-kwa-ra nwam nwunye sitere n’ab͕urum, na n’ulo nnam:

41 mb͕e ahu i gāpu n’iyi i ṅurum, mb͕e i gābiakute ab͕urum; ọ buru kwa na ha enyeghi gi ya, i gāpu kwa n’iyi i ṅurum.

42 M’we bia ta rue isi-iyi ahu, si, Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, biko, ọ buru na I nēme ijem nke mu onwem nēje ka ọ ga nke-ọma:

43 le, mu onwem nēguzo n’akuku isi-iyi miri a; ka o ru kwa, na nwa-ab͕ọgho ahu nke nāputa isere miri, onye m’gāsi ya, Biko, nyem nwantī miri site n’ite-gi ka m’ṅua;

44 onye gāsikwam, Gi onwe-gi ṅua, ọzọ kwa, camel-i ka m’gēsere miri nye: ka onye ahu buru nwayi Jehova rọputaworo nye nwa nke onye-nwem.

45 Ma tutu mu onwem agwasia obim okwu, le, Rebeka nāputa, ite-ya di kwa n’ubu-ya; ọ rida n’isi-iyi ahu, sere miri; m’we si ya, Biko, kwe ka m’ṅua.

46 Ọ me ngwa, si n’ubu-ya zie ite-ya, si, Ṅua, ọzọ kwa, camel-i ka m’gēme ka ha ṅua: m’we ṅua, camel ka ọ me-kwa-ra ka ha ṅua.

47 M’we jua ya, si, Nwa ònye ka i bu? Ọ si, Nwa Betuel ka m’bu, bú nwa Nehoa, onye Milka muru nye ya: m’we tiye nb͕a-aka ahu n’imi-ya, na ọla-aka abua ahu n’aka-ya abua.

48 M’we rube isi, kpọ isi ala nye Jehova, gọzie Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, Onye durumri n’uzọ ezi-okwu ilutara nwa onye-nwem nwa nwa-nne-ya nwoke na nwunye.

49 Ma ub͕u a, ọ buru na unu gaje ime ebere na ezi-okwu n’ebe onye-nwem nọ, gosinum: ma ọ buru na unu agaghi-eme ya, gosinum; ka m’we che iru n’aka-nri, ma-ọbu n’aka-ekpe.

50 Leban na Betuel we za, si, N’aka Jehova ka okwu a siteworo: ayi apughi igwa gi ihe ọjọ ma-ọbu ezi ihe.

51 Le, Rebeka nọ n’iru gi, kuru ya, la, ka ọ ghọrọ nwa onye-nwe-gi nwunye, dika Jehova kwuworo.

52 O rue, mb͕e orù Abraham nuru okwu nile ha, na ọ kpọrọ isi ala nye Jehova.

53 Orù ahu we chiputa ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe, nye Rebeka: ihe di iche iche nke di oké ọnu-ahia ka ọ nyekwara nwa-nne-ya nwoke na nne-ya.

54 Ha we rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ya onwe-ya na ndi ya na ha yikọrọ bia, ha we nọ ọnọdu-abali; ha we bilie n’ututu, ọ si, Zilagam na nke onye-nwem.

55 Ma nwa-nne-ya nwoke na nne-ya siri, Ka nwa-ab͕ọgho nọyere ayi ubọchi asa ma-ọbu iri; emesia ọ gēje.

56 Ọ si ha, Unu eb͕ochilam, ebe Jehova meworo ka uzọm ga nke-ọma; zilagam ka m’lakuru onye-nwem.

57 Ha si, Ayi gākpọ nwa-ab͕ọghọ ahu, juta ya n’ọnu-ya.

58 Ha we kpọ Rebeka, si ya, Ì gēso nwoke a je? Ọ si, M’gēje.

59 Ha we zilaga Rebeka, bú nwa-nne-ha, na nwayi nyere ya ara na nwata, na orù Abraham, na ndikom-ya.

60 Ha we gọzie Rebeka, si ya, Nwa-nne-ayi, gi onwe-gi ghọ nnù kwuru nnù madu, ọzọ, ka nkpuru-gi nweta ọnu-uzọ-ama nke ndi nākpọ ha asì.

61 Rebeka we bilie, ya na umu-ab͕ọghọ-ya, ha we nọkwasi n’elu camel-ha, so nwoke ahu je: orù ahu we kuru Rebeka, la.

62 Ma Aisak biarari site n’ije Bia-lahai-roi; n’ihi na ya onwe-ya bi n’ala Negeb.

63 Aisak we pua itughari uche-ya n’ọhia na mb͕e anyasi: ọ welie anya-ya abua, hu, ma, le, camel ufọdu nābia.

64 Rebeka we welie anya-ya abua, hu Aisak, si n’elu camel-ya rida.

65 Ọ si orù ahu, Ònye bu nwoke ahu nke nēje ije n’ọhia izute ayi? Orù ahu we si, Onye ahu bu onye-nwem: Rebeka we were ákwà-nkpudo-ya kpuchie onwe-ya.

66 Orù ahu we kọrọ Aisak akukọ bayere ihe nile o mere.

67 Aisak we me ka Rebeka bata n’ulo-ikwū Sera, bú nne-ya, o we kuru Rebeka, o we ghọ nwunye-ya; Aisak we hu ya n’anya: ewe kasie Aisak obi ka nne-ya nwusiri.

Categories
JENESIS

JENESIS 25

1 Abraham we luru nwunye ọzọ, nke aha-ya bu Ketura.

2 Ọ muara ya Zimram, na Jọkshan, na Medan, na Midian, na Ishbak, na Shua.

3 Jọkshan muru Sheba, na Dedan. Umu Dedan we buru Ashurim, na Letushim, na Leumim.

4 Umundikom Midian: Ifa na Ifēa, na Hanok, na Abida, na Eldea. Ndia nile bu umu Ketura.

5 Abraham we nye Aisak ihe nile o nwere.

6 Ma umu-ndikom nke iko-ndinyom nke Abraham nwere, Abraham nyere ha onyinye di iche iche; o we si n’ebe Aisak nwa-ya nọ zilaga ha n’Iru-anyanwu, rue ala Iru-anyanwu, mb͕e ọ nọ ndu.

7 Ma ndia bu ubọchi arọ nile nke ndu Abraham nke ọ diri, ọgu arọ asatọ na arọ iri na ise.

8 Abraham we kubie ume, nwua n’ezi isi-awọ, buru agadi, ndu-ya jukwara ya afọ; ewe chikọta ya na umu-nna-ya n’ala-mọ.

9 Aisak na Ishmael, bú umu-ya, we lìe ya n’ọb͕à Makpila, n’ọhia Efron nwa Zoha onye Het, nke di n’iru Mamre;

10 bú ọhia nke Abraham zutara n’aka umu Het: n’ebe ahu ka elìri Abraham na Sera, bú nwunye-ya.

11 O rue, mb͕e ọnwu Abraham gasiri, na Chineke gọziri Aisak nwa-ya; Aisak we biri n’akuku Bia-lahai-roi.

12 Ndia bu osuso-ọmumu Ishmael, nwa Abraham, onye Hega, bú nwayi Ijipt, bú nwayi nējere Sera ozi, muru nye Abraham:

13 ndia bu kwa aha umu-ndikom Ishmael, n’aha-ha, dika osuso-ọmumu-ha si di: ọkpara Ishmael, Nebaiot; na Kida, na Adbeel, na Mibsam,

14 na Mishma, na Duma, na Masa;

15 na Hedad, na Tima, na Jetua, na Nafish, na Kidema:

16 ndia bu umu-ndikom Ishmael, ndia bu kwa aha-ha, n’obodo ntà nile ha, na n’ebe-ulo-ikwū nile ha; ndi-isi iri na abua dika mba nile ha si di.

17 Ma ndia bu arọ nke ndu Ishmael, ọgu arọ isi na iri na asa: ọ we kubie ume, nwua; ewe chikọta ya na umu-nna-ya n’ala-mọ.

18 Ha we biri site na Havila rue Shua nke di n’iru Ijipt, mb͕e i nēje Asiria: n’iru umu-nne-ya nile ka ọ dara ada.

19 Ndia bu osuso-ọmumu Aisak nwa Abraham: Abraham muru Aisak:

20 Aisak b͕ara ọgu arọ abua mb͕e ọ lutara Rebeka na nwunye, bú nwa-nwayi Betuel onye Siria nke Padan-eram, nwa-nne-nwayi Leban onye Siria.

21 Aisak we riọ Jehova aririọ n’ihi nwunye-ya, n’ihi na nwayi-àgà ka ọ bu: Jehova we kwe ka ọ riọta ihe ọ riọrọ, Rebeka, bú nwunye-ya, we turu ime.

22 Umu-ya we b͕a nb͕a nime afọ ya; ọ si, Ọ buru na ọ di otú a, n’ìhi gini kwa ka mu onwem di ndu? Ọ we je iju Jehova ase.

23 Jehova we si ya,

Mba abua di n’afọ-gi,

Agēkewa kwa mba abua site n’úkwù-gi;

Otù mba gēnwe ume kari mba ibe-ya;

Nke-okenye gēfè nke-ntà.

24 Ubọchi-ya we zue imu nwa, ma, le, umu abua di n’afọ-ya.

25 Nke-mbu we puta nācha ọbara ọbara, aru-ya nile di ka uwe aji; ha we kpọ aha-ya Isọ.

26 Emesia nwa-nne-ya nwoke puta-kwa-ra, aka-ya nējide ikiri-ukwu Isọ; ewe kpọ aha-ya Jekob: Aisak b͕ara ọgu arọ atọ mb͕e Rebeka muru ha.

27 Umu-okoro ahu we tó etó: Isọ we buru nwoke mara ichu ntá, onye ọhia; ma Jekob bu nwoke zuru okè, nēbi n’ulo-ikwū.

28 Aisak we hu Isọ n’anya, n’ihi na ihe achutara na ntá nātọ ya utọ n’ọnu: ma Rebeka huru Jekob n’anya.

29 Jekob we sie ofé: Isọ we si n’ọhia bata, ya onwe-ya nāda kwa #mbà:

30 Isọ we si Jekob, Biko, kwe ka m’loda ufọdu nime ihe a nācha ọbara ọbara; n’ihi na ada-wom #mbà; n’ihi nka ka akpọrọ aha-ya Edom.

31 Jekob we si, Buru uzọ rebem ọnọdu-ọkpara-gi.

32 Isọ we si, Le, mu onwem gaje inwu anwu: ọ̀ gāba-kwa-ram urù gini, bú ọnọdu-ọkpara?

33 Jekob we si, Buru uzọ ṅuaram iyi; ọ ṅuara ya iyi: ọ we rebe Jekob ọnọdu-ọkpara-ya.

34 Jekob we nye Isọ achicha na ofé lentil; o rie ṅu kwa, o bilie, je nke ya: Isọ we leda ọnọdu-ọkpara-ya anya.

Categories
JENESIS

JENESIS 26

1 Oké unwu we di n’ala ahu, tukwasi oké unwu mbu nke di n’ubọchi Abraham. Aisak we jekuru Abimelek, bú eze ndi Filistia, rue Gera.

2 Jehova we me ka ọ hu Ya anya, Ọ si, Aridala n’Ijipt; biri n’ala ahu nke M’gāsi gi biri:

3 nọ dika ọbìa n’ala nka, M’gānọye-kwa-ra gi, gọzie gi; n’ihi na gi na nkpuru-gi ka M’gēnye ala ndia nile, M’gēme kwa ka iyi ahu guzosie ike, bú nke M’ṅuru Abraham nna-gi;

4 M’gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, M’gēnye kwa nkpuru-gi ala ndia nile; ọ bu kwa na nkpuru-gi ka mba nile nke uwa gāgọzi onwe-ha;

5 n’ihi na Abraham gere nti n’olum, we debe ihe-ndebem, ihe nile M’nyere n’iwu, ukpurum nile, na iwum nile.

6 Aisak we biri na Gera:

7 ndikom ebe ahu we jua ya ajuju bayere nwunye-ya; ọ si, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu: n’ihi na ọ turu egwu isi, Ọ bu nwunyem; ka ndikom ebe a we ghara ib͕um n’ihi Rebeka, ka o kwuru: n’ihi na nwayi nke di nma ile anya ka ọ bu.

8 O rue, mb͕e ubọchi ọ nọduru n’ebe ahu di anya, na Abimelek, bú eze ndi Filistia, leputara anya na window, hu, ma le, Aisak na Rebeka, bú nwunye-ya, nēgwu egwú.

9 Abimelek we kpọ Aisak, si, Le, nwunye-gi ka ọ bu n’ezie: ì si kwa aṅa si, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu? Aisak we si ya, N’ihi na asirim, Ka m’ghara inwu anwu n’ihi ya.

10 Abimelek we si, Gini bu nka i meworo ayi? ọ fọduru nwantī na otù onye nime ndi nkem gēsowori nwunye-gi dina, i gēmewo-kwa-ri ka ikpe-ọmuma biakwasi ayi.

11 Abimelek we nye ndi-ya nile iwu, si, Onye nēmetu nwoke a ma-ọbu nwunye-ya aka, aghaghi ime ka ọ nwua.

12 Aisak we gha nkpuru n’ala ahu, hu n’arọ ahu ọgu ise ọgu ise: Jehova we gọzie ya.

13 Nwoke ahu we di uku, ọ ga n’iru, nāga n’iru n’idi uku rue mb͕e ọ di uku nke-uku:

14 ọ we nwe ihe-nnweta, bú ìgwè ewu na aturu, na ihe-nnweta, bú igwè ehi, na ọtutu ndi-orù: ndi Filistia we nēkwo ya ekworo.

15 Ma olùlù-miri nile nke ndi-orù nna-ya gwururi n’ubọchi Abraham nna-ya, ndi Filistia kpochiri ha, were kwa ájá kpojue ha.

16 Abimelek we si Aisak, Si n’ebe ayi nọ la; n’ihi na i nwe ume kari ayi nke-uku.

17 Aisak we si n’ebe ahu je, ma-ulo-ikwū-ya na ndagwurugwu Gera, biri n’ebe ahu.

18 Aisak we gwu kwa olùlù-miri nile ọzọ nke ha gwururi n’ubọchi Abraham nna-ya; n’ihi na ndi Filistia kpuchiri ha mb͕e ọnwu Abraham gasiri: ọ kpọ ha aha di ka aha nke nna-ya kpọrọ ha-ri.

19 Ndi-orù Aisak we gwue na ndagwurugwu ahu, chọta olùlù-miri nāsuputa asuputa.

20 Ndi-ọzùzù anu-ulo Gera we so ndi-ọzùzù anu-ulo Aisak nēse okwu, si, Ọ bu ayi nwe miri ahu: ọ kpọ aha olùlù-miri ahu Isek; n’ihi na ha chọrọ ya okwu.

21 Ha gwue olùlù-miri ọzọ, se kwa okwu bayere ya: ọ kpọ aha-ya Sitna.

22 O si n’ebe ahu kwapu, gwue olùlù-miri ọzọ; ma ha eseghi okwu bayere ya: ọ kpọ aha-ya Rehobot, si, N’ihi na ub͕u a Jehova enyewo ayi ebe sara mbara, ayi gamu kwa ọmùmù n’ala nka.

23 O si n’ebe ahu rigorue Bia-sheba.

24 Jehova we me ka ọ hu Ya anya n’abali ahu, si, Mu onwem bu Chineke nke Abraham nna-gi: atula egwu, n’ihi na Mu na gi nọ, M’gāgọzi kwa gi, me ka nkpuru-gi ba uba n’ihi Abraham, bú orùm.

25 Ọ we wue ebe-ichu-àjà n’ebe ahu, kpọkue aha Jehova, ma ulo-ikwū-ya n’ebe ahu: ọ bu kwa n’ebe ahu ka ndi-orù Aisak gwuru olùlù-miri.

26 Abimelek we si na Gera jekuru ya, ya na Ahuzat, bú eyì-ya na Faikol, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya.

27 Aisak we si ha, Gini mere unu ji biakutem, ebe unu onwe-unu nākpọm asì, we si n’ebe unu nọ zilagam?

28 Ha si, Ayi ahuwo nke-ọma na Jehova nọyere gi: ayi we si, Biko, ka iṅu-iyi di n’etiti ayi, bú n’etiti ayi na gi, ka ayi na gi b͕a kwa ndu;

29 na i gaghi-eme ayi ihe ọjọ ma-ọli dika ayi nēmetughi gi aka na dika ayi meworo gi nání ezi ihe, ayi we zilaga gi n’udo: ub͕u a gi onwe-gi bu onye agọziri agọzi nke Jehova.

30 Ọ we mere ha oké oriri, ha rie ṅu kwa.

31 Ha bilie n’isi-ututu, ṅuritara onwe-ha iyi: Aisak we zilaga ha, ha si n’ebe ọ nọ la n’udo.

32 O rue n’ubọchi ahu, na ndi-orù Aisak biara, kọrọ ya akukọ bayere olùlù-miri ahu nke ha gwuru, si ya Ayi achọtawo miri.

33 Ọ kpọ ya Shiba: n’ihi nka aha obobo ahu bu Bia-sheba rue ta.

34 Mb͕e Isọ b͕ara ọgu arọ abua ọ luru Judit na nwunye, bú nwa-nwayi Beiri onye Het, ya na Basemat, bú nwa-nwayi Ilon onye Het:

35 ha we ghọrọ Aisak, ghọkwara Rebeka, ihe mọ-ilu.

Categories
JENESIS

JENESIS 27

1 I O rue, mb͕e Aisak ghọrọ agadi, mb͕e anya-ya abua nāhu kwa inyogho-inyogho, nke mere ka ọ ghara ihu uzọ, na ọ kpọrọ Isọ, bú nwa-ya nke-okenye, si ya, Nwam: ọ si ya, Lekwam.

2 Ọ si, Biko, le, aghọwom agadi, amaghi ubọchi ọnwum.

3 Ma ub͕u a, biko, chiri ihe-gi, bú àkpà-àkú-gi na uta-gi, pua je ọhia, chutaram anu-nchuta;

4 sierem nri utọ, dika nke m’huru n’anya, butekwara m, ka m’we rie; ka nkpuru-obim we gọzie gi tutu mu anwua.

5 Ma Rebeka nānu ya mb͕e Aisak gwara Isọ, bú nwa-ya, okwu. Isọ we je ọhia ichuta anu-nchuta, na iweta ya.

6 Rebeka we gwa Jekob, bú nwa-ya, okwu, si Le, anurum nna-gi ka ọ nāgwa Isọ nwanne-gi okwu, si,

7 Wetaram anu-nchuta, sierem nri utọ, ka n’we rie, gọzi kwa gi n’iru Jehova tutu ọnwum.

8 Ma ub͕u a, nwam, ge nti n’olum, dika ihe nke mu onwem nēnye gi n’iwu si di.

9 Biko, je ebe ìgwè ewu na aturu di, si n’ebe ahu chitaram umu-ewu abua di nma; m’gēwere kwa ha siere nna-gi nri utọ, dika nke ọ huru n’anya:

10 i gēbuga-kwa-ra nna-gi, ka ọ we rie, ka ọ we gọzie gi tutu ọnwu-ya.

11 Jekob we si Rebeka nne-ya, Le, Isọ nwannem bu nwoke b͕ara aji, ma mu onwem bu nwoke nāb͕aghi aji.

12 Eleghi anya nnam gēbitum aka, m’agādi kwa ka onye nākwa emò n’anya-ya; m’gēme kwa ka nkọcha biakwasim, ọ bughi kwa ngọzi.

13 Nne-ya we si ya, Ya dikwasim, bú nkọcha-gi, nwam: nání ge nti n’olum, je chitaram ha.

14 Ọ je, chita, butere nne-ya: nne-ya we sie nri utọ, dika nke nna-ya huru n’anya.

15 Rebeka we chiri uwe di oké ọnu-ahia nke Isọ, bú nwa-ya nke-okenye nke di n’aka-ya n’ulo, ọ we yibe Jekob, bú nwa-ya nke-ntà:

16 ọ chiri kwa akpukpọ umu-ewu ahu yibe ya n’aka-ya abua na n’olu-ya ebe aji nādigh:

17 o nye Jekob, bú nwa-ya, nri utọ na achicha n’aka, bú nke o doziri.

18 O we biakute nna-ya, si Nna m: ọ si, Lekwam; ònye ka i bu, nwam?

19 Jekob we si nna-ya, Mu onwem bu Isọ ọkpara-gi; emewom dika i gwaram: biko, bilie, nọdu, rie ufọdu n’anu m’chutara, ka nkpuru-obi-gi we gọziem.

20 Aisak we si nwa-ya, Ì si kwa aṅa me ngwa ichọta ya, nwam? Ọ si, N’ihi na Jehova, bú Chineke-gi, mere ka o zutem.

21 Aisak we si Jekob, Biko, bia nso, ka m’we bitu gi aka, nwam, ma gi onwe-gi bu nwam Isọ ahu, ma-ọbu na i bughi ya.

22 Jekob we jekuru Aisak nna-ya nso; o bitu ya aka, si, Olu a bu olu Jekob, ma aka ndia bu aka Isọ.

23 Ma ọ mataghi ya, n’ihi na aka-ya abua bu aji aji, dika aka Isọ nwa-nne-ya: o we gọzie ya.

24 Ọ si, Gi onwe-gi, ì bu kwa nwam Isọ? Ọ si, Mu onwem bu ya.

25 Ọ si, Buterem ya nso, ka m’ri kwa ufọdu nime anu nwam chutara, ka nkpuru-obim we gọzie gi. O we butere ya nso, o rie: o butekwara ya manya-vine, ọ nua.

26 Aisak nna-ya we si ya, Biko, bia nso, sutum ọnu nwam.

27 Ọ bia nso, sutu ya ọnu: o we nu ísi uwe-ya, gọzie ya, si,

Le, ísì nwam

Di ka ísi ọhia nke Jehova gọzi-woro:

28 Ka Chineke nye gi ufọdu nime igirigi elu-igwe,

Na ufọdu nime ebe di urù nke ala,

Na ọka na manya-vine ọhu ri nne:

29 Ka ndi di iche iche fè gi,

Ka mba di iche iche kpọ isi ala nye gi:

Buru onye nwere ike n’aru umunne-gi,

Ka umu nke nne-gi kpọ kwa isi ala nye gi:

Ka onye ọ bula nke nābu gi ọnu buru onye anābu ọnu,

Ka onye ọ bula nke nāgọzi gi buru kwa onye agọziri agọzi.

30 O rue, mb͕e Aisak gọzisiri Jekob, mb͕e Jekob nọ kwa nāpù n’iru Aisak nna-ya ub͕u a, na Isọ nwa-nne-ya siri n’ichu-ntá-ya bata.

31 Ya onwe-yasi-kwa-ra nri utọ, butere nna-ya, si nna-ya, Ka nnam bilie, rie ufọdu nime anu nwa-ya chutara, ka nkpuru-obi-gi we gọziem.

32 Aisak nna-ya we si ya, Ònye ka i bu? Ọ si, Mu onwem bu nwa-gi, ọkpara-gi, bú Isọ.

33 Aisak we ma jijiji nke-uku nke-uku, si Ònye kwa bu onye ahu nke chutaworo anu-nchuta, buterem, m’we rie ufọdu nime nri ahu nile tutu i bia, m’we gọzie ya? onye agọziri agọzi ka ọ gābu kwa.

34 Mb͕e Isọ nuru okwu nna-ya ndia, o tie oké nkpu di ilu nke-uku, si nna-ya, Gọziem, ọbuná mu onwem, nnam.

35 Ọ si, Nwa-nne-gi biara n’aghughọ, nara ngọzi-gi.

36 Ọ si, Ọ̀ bu na akpọrọ aha-ya Jekob na o jidewom ikiri-ukwu ub͕ò abua ndia? ọnọdu-ọkparam ka ọ nara: ma, le, ub͕u a ka ọ naraworo ngọzim. Ọ si, Ọ̀ dighi ngọzi i debeworom?

37 Aisak we za, si Isọ, Le, edowom ya onye nwere ike n’aru gi, ọ bu kwa umunne-ya nile ka m’nyeworo ya ka ha buru ndi-orù-ya; ewerewokwam ọka na manya-vine ọhu me ka o guzosie ike: gini kwa ka m’gēmere gi, nwam?

38 Isọ we si nna-ya, Ọ̀ bu nání otú ngọzi ka i nwere, nnam? gọziem, ọbuná mu onwem, nnam. Isọ we welie olu-ya, kwa ákwá.

39 Aisak nna-ya we za, si ya,

Le, site n’ebe di urù nke ala ka ebe-obibi-gi gādi,

Site kwa n’igirigi nke elu-igwe site n’elu;

40 Ọ bu kwa mma-agha-gi ka i gēji di ndu, ọ bu kwa nwa-nne-gi ka i gēfe;

O gēru kwa, mb͕e, i gālù, ulù,

Na i gētijipu yoke-ya n’olu-gi.

41 Isọ we kpọ Jekob asì n’ihi ngọzi ahu nke nna-ya gọziri ya: Isọ we si n’obi-ya, Ubọchi iru-újú bayere nnam nābiaru nso; m’gēb͕u kwa Jekob nwa-nnem.

42 Ewe gosi Rebeka okwu ndia nke Isọ nwa-ya nke-okenye; o zìe, kpọ Jekob, bú nwa-ya nke-ntà, si ya, Le Isọ nwa-nne-gi nākasi onwe-ya obi bayere gi, nēzube ib͕u gi.

43 Ma ub͕u a, nwam, ge nti n’olum; bilie, b͕akuru Leban, bú nwa-nnem nwoke, rue Heran;

44 gi na ya nọ ubọchi ole-na-ole, rue mb͕e ọnuma nwa-nne-gi gālaghachi;

45 rue mb͕e iwe nwa-nne-gi gēsi n’aru gi laghachi, ọ we chezọ ihe i meworo ya: m’gēziga kwa, si n’ebe ahu kulata gi: n’ìhi gini ka m’gēji kwa b͕ara aka unu abua, bú umum, n’otù ubọchi?

46 Rebeka we si Aisak, Ike ndum agwusiwom site n’iru umu-ndinyom Het: ọ buru na Jekob luru nwunye sitere n’umu-ndinyom Het, dika ndia, bú site n’umu-ndinyom ala nka, ùrù gini ka ndu baram?

Categories
JENESIS

JENESIS 28

1 Aisak we kpọ Jekob, gọzie ya, nye ya iwu, si ya, Gi alula nwunye sitete n’umu-ndinyom Keneam.

2 Bilie, je Padan-eram, rue ulo Betuel, bú nna nne-gi; si n’ebe ahu lutara onwe-gi nwunye sitere n’umu-ndinyom Leban, bú nwa-nne-nwoke nne-gi.

3 Ka Chineke Nke puru ime ihe nile gọzie gi, me ka i mua, ọmùmù, Ya me kwa ka i ba uba, ka i we ghọ nkpọkọta nke ndi di iche iche:

4 Ya nye kwa gi ngọzi Abraham, gi, na nkpuru-gi tiyere gi; ka i we nweta ala nke ọnọdu-ọbìa-gi nile, nke Chineke nyere Abraham.

5 Aisak we zipu Jekob: ọ je Padan-eram, jekuru Leban, nwa Betuel onye Siria, bú nwa-nne-nwoke Rebeka, nne Jekob na Isọ.

6 Isọ we hu na Aisak gọziri Jekob, zipu kwa ya ije Padan-eram, isi n’ebe ahu lutara onwe-ya nwunye; ọ hu kwa na, mb͕e ọ nāgọzi ya, na ọ nyere ya iwu, si, Gi alula nwunye sitere n’umu-ndinyom Kenean;

7 ọ hu kwa na Jekob gere nna-ya, ge kwa nne-ya, nti, we je Padan-eram:

8 Isọ we hu na umu-ndinyom Kenean jọrọ njọ n’anya Aisak nna-ya;

9 Isọ we jekuru Ishmael lutara onwe-ya Mahalat na nwunye, bú nwa-nwayi Ishmael nwa Abraham, bú nwa-nne-nwayi Nebaiot, tiyere ndinyom ọ nwere.

10 Jekob we pua na Bia-sheba, nēje Heran.

11 Ọ biarue n’otù ebe, nọ ọnọdu-abali n’ebe ahu, n’ihi na anya-nwu adawo; ọ were otù nime nkume nke ebe ahu, dọba n’okpuru isi-ya, we dina n’ebe ahu

12 Ọ rọ nrọ, ma, le, ubube nke eguzoro n’ala, ma elu-ya nēmetu ebe elu-igwe di: ma, le, ndi-mọ-ozi Chineke nārigo nārida na ya.

13 Ma, le, Jehova nēguzo n’elu ya, si, Mu onwem bu Jehova, Chineke nke Abraham nna-gi, na Chineke nke Aisak’ ala nke gi onwe-gi nēdina n’elu ya, gi ka M’gēnye ya, nye kwa nkpuru-gi;

14 nkpuru-gi gādi kwa ka ájá ala, i gāb͕asa n’uzọ Ọdida anyanwu na n’uzọ Iru-anyanwu na n’uzọ Ugwu na n’uzọ Ndida: agāgọzi kwa ab͕uru nile nke elu-uwa nime gi na nime nkpuru-gi.

15 Ma, le, Mu onwem nọyere gi, M’gēdebe kwa gi n’ebe ọ bula i nēje, M’gēme kwa ka i lata n’ala nka; n’ihi na M’gaghi-arapu gi, rue mb͕e m’gēmewori ihe M’gwaworo gi okwu bayere ya.

16 Jekob we teta n’ura-ya, si, N’ezie Jehova nọ n’ebe a; ma mu onwem amaghi ya.

17 Ọ tua egwu, si, Le, otú ebe a di egwù nke-uku! nka abughi ihe ọzọ ma-ọbughi nání ulo Chineke, nka bu kwa ọnu-uzọ-ama elu-igwe.

18 Jekob we bilie n’isi-ututu, were nkume ahu nke ọ dọbara n’okpuru isi-ya, do ya ka ọ buru ogidi, ọ wusa manu n’elu ya.

19 Ọ kpọ aha ebe ahu Bet-el: ma otú ọ di Luz bu aha obodo ahu na mbu.

20 Jekob we kwe nkwa, si, Ọ buru na Chineke gānọyerem, debem n’uzọ a nke mu onwem nēje, nyem nri ka m’we rie, na uwe ka m’we yie,

21 m’we lata n’ulo nnam n’udo, Jehova gābu-kwa-ram Chineke,

22 nkume a, nke m’doworo ka ọ buru ogidi, gābu kwa ulo Chineke: ihe nile I gēnyem, aghaghkwam inye Gi otù uzọ n’uzọ iri.

Categories
JENESIS

JENESIS 29

1 Jekob we zọlie ukwu-ya, jerue ala umu Iru-anyanwu.

2 Ọ hu, ma, le, olùlù-miri n’ọhia, ma, le, n’ebe ahu ìgwè ewu na aturu atọ nāmakpu n’akuku ya; n’ihi na ọ bu n’olùlù-miri ahu ka ha nēme ka ìgwè aturu-ha ṅua: nkume di kwa uku nke di n’elu ọnu olùlù-miri ahu.

3 Anāchikọta kwa ìgwè aturu nile n’ebe ahu: ha akpọrepu nkume ahu n’elu ọnu olùlù-miri ahu, me ka ìgwè ewu na aturu ṅua, ha eweghachi nkume n’elu ọnu olùlù-miri n’ọnọdu-ya.

4 Jekob we si ha, Umu-nnem, òle ebe unu si bia? Ha si, Heran ka ayi si bia.

5 Ọ si ha, Unu mara Leban nwa Nehoa? Ha si, Ayi mara ya.

6 Ọ si ha, Ọ̀ nọ n’udo? Ha si, Ọ nọ n’udo: ma, le, Rechel, bú nwa-ya nwayi, nābia, ya na ìgwè ewu na aturu-ya.

7 Ọ si, Le, ubọchi fọduru ri nne, nka abughi mb͕e anāchikọta anu-ulo: menu ka ìgwè ewu na aturu-unu ṅua miri, jenu zùa ha.

8 Ha si, Ayi apughi, rue mb͕e agāchikọta ìgwè aturu nile, ha we kpọrepu nkume n’elu ọnu olùlù miri a: ayi we me ka ìgwè ewu na aturu nua.

9 Mb͕e ọ nọ nākpayere ha uka, Rechel biara ya na ìgwè ewu na aturu nke nna-ya nwere; n’ihi na onye-ọzùzù-aturu ka ọ bu.

10 O rue, mb͕e Jekob huru Rechel, bú nwa-nwayi Leban nwa-nne-ya, na ìgwè ewu na aturu Leban, bú nwanne nne-ya, na Jekob jeruru nso, kpọrepu nkume ahu n’elu ọnu olùlù-miri ahu, me ka ìgwè ewu na aturu Leban, bú nwanne nne-ya, ṅua.

11 Jekob we sutu Rechel ọnu, welie olu-ya, kwa ákwá.

12 Jekob we gosi Rechel na nwa-nne nna-ya ka ọ bu, na nwa Rebeka ka ọ bu kwa: ọ we b͕a ọsọ, gosi nna-ya.

13 O rue, mb͕e Leban nuru akukọ Jekob, bú nwa nwa-nne-ya, na ọ b͕ara ọsọ izute ya, ọ b͕akua ya, sutu ya ọnu nke-uku, me ka ọ ba n’ulo-ya. Ọ we kọrọ Leban ihe nile ndia.

14 Leban we si ya, N’ezie ọkpukpum na anu-arum ka i bu. Ya na ya we nọ ogologo otù ọnwa.

15 Leban we si Jekob, Ọ̀ bu n’ihi na nwa-nnem ka i bu na i gēfèm n’efu? gosim, gini gābu ugwọ-ọlu-gi?

16 Ma Leban nwere umu-ndinyom abua: aha nke-okenye bu Lia, aha nke-ntà bu Rechel.

17 Anya Lia esighi ike; ma Rechel mara nma n’aru ma kwa nma ile anya.

18 Jekob we hu Rechel n’anya; ọ si, M’gēfè gi arọ asa n’ihi Rechel, bú nwa-gi nwayi nke-ntà.

19 Leban we si, Ọ di nma ka m’nye gi ya, kari were ya nye nwoke ọzọ: nọyerem.

20 Jekob we fè òfùfè n’ihi Rechel arọ asa; ha di n’anya-ya dika ubọchi ole-na-ole, n’ihi ihu-n’anya o ji hu ya.

21 Jekob we si Leban, Nyem nwunyem, n’ihi na ubọchim nile ezuwo, ka m’we bakuru ya.

22 Leban we chikọta ndi ebe ahu nile, me oké oriri.

23 O rue, n’anyasi, na o kuru Lia nwa-ya, me ka ọ bakuru Jekob; Jekob we bakuru ya.

24 Leban we nye ya Zilpa, bú nwayi nējere ya ozi, ka ọ buru nwayi nējere Lia nwa-ya nwayi ozi.

25 O rue na, n’ututu Jekob wee hu na nwanyi ahu bu Lia: ọ we si Leban, Gini bu nka i meworom? Ọ̀ bughi n’ihi Rechel ka m’efère òfùfè n’aka gi? n’ihi gini kwa ka i ghọb͕urum?

26 Leban we si, Adighi-eme otú a n’ebe nke ayi, inye nke-ntà tutu enye nke-okenye.

27 Debezue abali asa nke nwayi a, ma ayi gēnye kwa gi nwayi a n’ihi òfùfè i gēfè kwa ọzọ n’akam arọ asa ọzọ.

28 Jekob we me otú a, debezu abali asa nke Lia: ọ we nye ya Rechel nwa-ya na nwunye.

29 Leban we were Bilha, bú nwayi nējere ya ozi, nye Rechel nwa-ya nwayi, ka ọ buru nwayi nējere ya ozi.

30 Ọ we bakuru kwa Rechel, ọ we hu kwa Rechel n’anya kari Lia, we nēfè òfùfè n’aka Leban arọ asa ọzọ.

31 Jehova we hu na onye anākpọ asì ka Lia bu, Ọ we meghe àkpà-nwa-ya: ma Rechel bu nwayi-àgà.

32 Lia we turu ime, mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Reuben: n’ihi na ọ siri, N’ihi na Jehova elekwasiwo nweda-n’alam anya; n’ihi na ub͕u a dim gāhum n’anya.

33 Ọ turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke; ọ we si, N’ihi na Jehova anuwo na onye anākpọ asì ka m’bu, n’ihi ya ka Ọ nye-kwa-ram nka: ọ we kpọ aha-ya Simeon.

34 Ọ turu ime ọzọ, mua-nwoke; ọ we si, Ub͕u a na mb͕e a ka dim gārapara n’arum, n’ihi na amuworom ya umu-ndikom atọ: n’ihi nka ka akpọrọ aha-ya Livai.

35 Ọ turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke: ọ we si, Na mb͕e a ka m’gēkele Jehova: n’ihi nka ka ọ kpọrọ aha-ya Juda; ọ we kwusi imu nwa.

Categories
JENESIS

JENESIS 30

1 Ma mb͕e Rechel huru na ọ mughi umu nye Jekob, Rechel we kwo nwa-nne-ya nwayi ekworo. ọ si Jekob, Nyem umu, ma ọ buru na inyeghm, onye nwuru anwu ka m’bu.

2 Iwe Jekob we di ọku megide Rechel: ọ si, Ọ̀ bu n’ọnọdu Chineke ka m’nọ, Onye b͕ochiworo gi nkpuru nke afọ?

3 Rechel we si, Le, orùm nwayi Bilha, bakuru ya, ka ọ we mua nwa n’ikperem abua, ewe site kwa na ya wuliem elu dika ulo, ọbuná mu onwem.

4 Ọ nye ya Bilha na nwunye, bú nwayi nējere ya ozi: Jekob we bakuru ya.

5 Bilha we turu ime, muara Jekob nwa-nwoke.

6 Rechel we si, Chineke ekpeputawom, ọzọ kwa, ọ nuwo olum, we nyem nwa-nwoke: n’ihi nka ka ọ kpọrọ aha-ya Dan.

7 Bilha, bú nwayi nējere Rechel ozi, we turu ime ọzọ, muara Jekob nwa-nwoke nke-abua.

8 Rechel we si, Nb͕a Chineke ka mu na nwa-nnem nwayi b͕aworo, enwewokwam ike: o we kpọ aha-ya Naftali.

9 Mb͕e Lia huru na ọ kwusiri imu nwa, ọ were Zilpa, bú nwayi nējere ya ozi, nye Jekob na nwunye.

10 Zilpa, bú nwayi nējere Lia ozi, we muara Jekob nwa-nwoke.

11 Lia we si, Enwerem isi-ọma! ọ we kpọ aha-ya Gad.

12 Zilpa, bú nwayi nējere Lia ozi, we muara Jekob nwa-nwoke nke-abua.

13 Lia we si, Na mb͕e ọ nāgaram nke-ọma! n’ihi na umu-ndinyom madu akpọwom onye ihe nāgara nke-ọma: ọ we kpọ aha-ya Asha.

14 Reuben we je na mb͕e obìbì ọka wheat, chọta mandrake n’ọhia, chita ha nye Lia nne-ya. Rechel we si Lia, Biko, nyem ufọdu nime mandrake nwa-gi.

15 Ọ we si ya, Ọ̀bu okwu ntà na i narawo dim? ì gānara kwa mandrake nwam? Rechel we si, N’ihi nka gi na ya gēdina n’abali a n’ihi mandrake nwa-gi.

16 Jekob we si n’ọhia bata n’anyasi, Lia we pua izute ya, si, Mu ka i gābakute; n’ihi na achiriwom mandrake nwam gota gi n’ezie. Ọ we dinayere ya n’abali ahu,

17 Chineke we ge Lia nti, ọ we turu ime, muara Jekob nwa-nwoke nke-ise.

18 Lia we si, Chineke enyewom ugwo-ọlum, n’ihi na enyerem dim nwayi nējerem ozi’ o we kpọ aha-ya Isaka.

19 Lia we turu ime ọzọ, muara Jekob nwa-nwoke nke-isi.

20 Lia we si, Chineke enyewom ezi onyinye; mb͕e a dim gēbiyerem, n’ihi na amuworom ya umu-ndikom isi: ọ we kpọ aha-ya Zebulun.

21 Emesia ọ mu-kwa-ra nwa-nwayi, kpọ aha-ya Daina.

22 Ma Chineke chetara Rechel, Chineke we ge ya nti, meghe àkpà-nwa-ya.

23 Ọ we turu ime, mua nwa-nwoke, si, Chineke ekpochapuwo ita-utam:

24 ọ we kpọ aha-ya Josef, si, Ka Jehova tukwasirim nwa-nwoke ọzọ.

25 O rue, mb͕e Rechel musiri Josef, Jekob siri Leban, Zilagam, ka m’we la n’ebem, na n’alam.

26 Nyem ndinyom na umum ndi m’fèworo gi òfùfè n’ihi ha, ka m’la kwa: n’ihi na gi onwe-gi amawo òfùfèm nke m’fèworo gi.

27 Leban we si ya, Biko, ọ buru na ahutawom amara n’iru gi, gi nọgide: n’ihi na aribawom ama na Jehova agọziwom n’ihi gi.

28 Ọ si kwa, Kparam ókè ugwọ-ọlu-gi, m’gēnye kwa gi.

29 Ọ si ya, Gi onwe-gi amawo òfùfè m’fèworo gi, na ihe anu-ulo-gi ghọworo n’akam.

30 N’ihi na nwanti ka ihe i nwere bu tutu mu abia, ma ọ basawo rue ọtutu; Jehova agọziwo kwa gi n’ije-ukwum: ma ub͕u a òle mb͕e ka mu onwem gēme-kwa-ra ulom?

31 Ọ si, Gini ka m’gēnye gi? Jekob we si, I gaghi-enyem ihe ọ bula: ọ buru na i gēmerem ihe a, m’gāzù ìgwè ewu na aturu-gi ọzọ, debe kwa ya.

32 M’gāgabiga n’etiti ìgwè ewu na aturu-gi nile taa, si n’ebe ahu wezuga aturu ọ bula turu agwa na ntupọ, na aturu ọ bula di nji n’etiti aturu, na nke turu ntupọ na agwa n’etiti ewu: ọ gābu ugwọ-ọlum.

33 Ezi omumem gāza-kwa-ram n’ọdi-n’iru, mb͕e i gābia bayere ugwọ-ọlum nke di n’iru gi: nke ọ bula nke nātughi agwa na ntupọ n’etiti ewu, nkem nke nādighi kwa nji n’etiti aturu nkem, ihe ezuru ori ka nke ahu bu n’akam.

34 Leban we si, Le, biko, ya di ka okwu-gi si di.

35 O we wezuga n’ubọchi ahu nkpi nile dere ọcha na nke turu ntupọ, na nne-ewu nile turu agwa na ntupọ, nke ọ bula nke nwere ọcha nime ya, na nke ọ bula di nji n’etiti aturu, o nye ha n’aka umu-ya ndikom;

36 o je ije nke ubọchi atọ n’etiti ya na Jekob: ma Jekob nāzù ìgwè ewu na aturu Leban fọduru.

37 Jekob we chiri n’onwe-ya nkpa-n’aka nke osisi poplar di ndu, na nke osisi almond, na nke osisi plane; o kpechaputa ebe di ọcha nime ha, nēme ka ọcha nke di nime nkpa-n’aka ahu puta ìhè.

38 O we guzo nkpa-n’aka ahu nke o kpere na ncherita-iru ìgwè ewu na aturu n’ebe anētiye miri n’ihe anu-ulo ji aṅu miri, ebe ìgwè ewu na aturu nābia iṅu miri; ha we turu ime mb͕e ha biara iṅu miri.

39 Ìgwè ewu na aturu ahu we turu ime n’iru nkpa-n’aka ahu, ìgwè ewu na aturu ahu we mua umu dere ọcha, na nke turu agwa, na nke turu ntupọ.

40 Jekob we wezuga umu-aturu, me ka ìgwè ewu na aturu che iru na nke dere ọcha na nke ọ bula di nji n’ìgwè ewu na aturu Leban; o we do ìgwè nke aka ya n’onwe-ha iche, ma o doghi ha n’ebe ìgwè ewu na aturu Leban di.

41 O rue, mb͕e ọ bula ndi di ike nime ìgwè ewu na aturu turu ime, na Jekob tọb͕ọrọ nkpa-n’aka ahu n’iru anya ìgwè ewu na aturu n’ebe anētiye miri, ka ha we turu ime n’etiti nkpa-n’aka ahu;

42 ma mb͕e ìgwè ewu na aturu nādighi ike, ọ dighi-atọb͕ọ ha: ndi nādighi ike we diri Leban, ma ndi di ike diri Jekob.

43 Nwoke ahu we basa nke-uku nke-uku, ọ we nwe ìgwè ewu na aturu ri nne, na ndinyom nēje ozi, na orù-ndikom, na camel na inyinya-ibu di ọtutu.