Categories
JENESIS

JENESIS 11

1 Uwa nile we nwe otù asusu na otù uzọ okwu.

2 O rue, mb͕e ha buliri ije n’Iru-anyanwu, na ha chọtara ala di lari n’ala Shaina; ha we biri n’ebe ahu.

3 Ha we sirita ibe-ha, Ngwa, ka ayi kpua brick, kpọ ha ọku nke-ọma. Ha we nwe “brick” n’ọnọdu nkume, ọ bu kwa bitumen ka ha nwere n’ọnọdu urọ.

4 Ha we si, Ngwa, ka ayi wuere onwe-ayi obodo, na ulo-elu, nke elu-ya gēru n’elu-igwe, ka ayi mekwara onwe-ayi aha; ka ayi we ghara ib͕asa n’elu uwa nile.

5 Jehova we ridata ihu obodo ahu na ulo-elu ahu, nke umu madu wuru.

6 Jehova we si, Le, ha bu otù ndi, ọ bu kwa otù asusu ka ha nile nwere; nka bu kwa ihe ha nāmalite ime: ub͕u a agaghi-eb͕ochiri ha ihe ọ bula nke ha nēzube ime.

7 Ngwa, ka ayi rida, ghagbue asusu-ha n’ebe ahu, ka ha we ghara inurita asusu ibe-ha.

8 Jehova we me ka ha si n’ebe ahu b͕asa n’elu uwa nile: ha we rapu iwu obodo ahu.

9 N’ihi nka ka akpọrọ aha-ya Bebel; n’ihi na n’ebe ahu ka Jehova ghab͕uru asusu uwa nile: ọ bu kwa n’ebe ahu ka Jehova mere ka ha si b͕asa n’elu uwa nile.

10 Ndia bu usoro-ọmumu Shem. Shem b͕ara ọgu arọ ise, mua Apakshad arọ abua ka iju-miri ahu gasiri:

11 Shem di ndu, mb͕e ọ musiri Apakshad, nnù arọ na ọgu ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

12 Apakshad di ndu orú arọ na iri na ise, mua Shela:

13 Apakshad di ndu, mb͕e ọ musiri Shela, nnù arọ na atọ, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

14 Shela di ndu orú arọ na iri, mua Iba:

15 Shela di ndu, mb͕e ọ musiri Iba, nnù arọ na atọ, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

16 Iba di ndu orú arọ na iri na anọ, mua Peleg:

17 Iba di ndu, mb͕e ọ musiri Peleg, nnù arọ na orú na iri, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

18 Peleg di ndu orú arọ na iri, mua Reu:

19 Peleg di ndu, mb͕e ọ musiri Reu, ọgu arọ iri na arọ iteghete, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

20 Reu di ndu orú arọ na iri na abua, mua Serug:

21 Reu di ndu, mb͕e ọ musiri Serug, ọgu arọ iri na arọ asa, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

22 Serug di ndu orú arọ na iri, mua Nehoa:

23 Serug di ndu, mb͕e ọ musiri Nehoa, ọgu arọ iri, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

24 Nehoa di ndu orú arọ na iteghete, mua Tira:

25 Nehoa di ndu, mb͕e ọ musiri Tira, ọgu arọ ise na iri na iteghete, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

26 Tira di ndu ọgu arọ atọ na iri, mua Abram, na Nehoa, na Heran.

27 Ma ndia bu osuso-ọmumu Tira. Tira muru Abram na Nehoa na Heran; Heran muru Lot.

28 Heran we nwua n’iru nna-ya Tira n’ala amuru ya, n’Ua nke ndi Kaldea.

29 Abram na Nehoa we lutara onwe-ha nwunye; aha nwunye Abram bu Serai; aha nwunye Nehoa bu Milka, nwa-nwayi Heran, bú nna Milka na nna Iska.

30 Ma Serai bu nwayi-àgà; ọ dighi nwa ọ nwere.

31 Tira we chiri Abram, bú nwa-ya nwoke, na Lot, bú nwa-nwoke nke Heran, ya bu nwa nwa-ya, na Serai, bú nwunye nwa-ya, bú nwunye Abram nwa-ya nwoke; ha na ha we si n’Ua nke ndi Kaldea pua, ije ala Kenean; ha biarue Heran, biri n’ebe ahu.

32 Ubọchi nile nke Tira we buru ọgu arọ iri na arọ ise: Tira we nwua nime Heran.

Categories
JENESIS

JENESIS 12

1 Jehova we si Abram, Si n’ala-gi, si kwa n’umu-nna-gi, si kwa n’ulo nna-gi, je nke gi rue ala ahu nke M’gēme ka i hu ya anya:

2 M’gēme kwa gi ka i ghọ mba uku, M’gāgọzi kwa gi, me ka aha-gi di uku; gi buru kwa ngọzi:

3 M’gāgọzi kwa ndi nāgọzi gi, ọ bu kwa onye nākọcha gi ka M’gābu ọnu: agāgọzi kwa ab͕uru nile nke uwa nime gi.

4 Abram we je, dika Jehova gwara ya okwu; Lot we so ya je: Abram b͕ara ọgu arọ atọ na iri na ise mb͕e o siri na Heran pua.

5 Abram we chiri Serai, bú nwunye-ya, na Lot, bú nwa nwa-nne-ya, na àkù-ha nile nke ha kpatarari, na madu ndi ha nwetarari nime Heran; ha we pua ije ala Kenean; ha we ba n’ala Kenean.

6 Abram we gabiga n’ala ahu rue ebe Shekem, rue osisi terebinth nke More. Ndi Kenean nọ n’ala ahu mb͕e ahu.

7 Jehova we me ka Abram hu Ya anya, Ọ si, Nkpuru-gi ka M’gēwere ala nka nye: ọ we wuere Jehova, bú Onye ahu Nke mere ka ọ hu Ya anya, ebe-ichu-aja n’ebe ahu.

8 Ọ we si n’ebe ahu kwapu je ugwu ahu di n’Iru-anyanwu Bet-el, ọ ma ulo-ikwū-ya, Bet-el di n’Ọdida-anyanwu, Ai di n’Iru-anyanwu: o wuere Jehova ebe-ichu-aja n’ebe ahu, kpọkue aha Jehova.

9 Abram we bulie ije, nēje nēbuli kwa ije n’uzọ Negeb.

10 Oké unwu we di n’ala ahu: Abram we ridarue Ijipt inọ n’ebe ahu dika ọbìa; n’ihi na oké unwu ahu di ike n’ala.

11 O rue, mb͕e ọ biaruru nso iba n’Ijipt, na ọ siri Serai, bú nwunye-ya, Biko, le, amaram na nwayi mara nma ile anya ka i bu:

12 O gēru kwa, mb͕e ndi Ijipt gāhu gi, na ha gāsi, Nwunye-ya ka nwayi a bu: ha ewe b͕uem, ma gi ka ha gēdebe ndu.

13 Biko, si na ọ bu nwa-nnem nwayi ka i bu: ka ọ we dirim nma n’ihi gi, ka nkpuru-obim we di kwa ndu n’ihi gi.

14 O rue, mb͕e Abram batara n’Ijipt, na ndi Ijipt huru nwayi ahu na nwayi mara nma nke-uku ka ọ bu.

15 Ndi-isi Fero we hu ya, too ya n’iru Fero: ewe kubata nwayi ahu n’ulo Fero.

16 Ọ we me Abram nke-ọma n’ihi ya: ọ we nwe ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na oke-inyinya-ibu, na ndi-orù ndikom, na ndinyom nēje ozi, na nne-inyinya-ibu, na kamel.

17 Ma Jehova were ihe-ọjọọ uku di iche iche tie Fero na ulo-ya n’ihi okwu bayere Serai, bú nwunye Abram.

18 Fero we kpọ Abram, si, Gini bu nka i meworom? n’ìhi gini ka a nēgosighm na nwunye-gi ka ọ bu?

19 N’ihi gini ka i siri, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu? m’we luta ya n’onwem na nwunye: ma ub͕u a, le nwunye-gi, kuru ya, la.

20 Fero we nye ndikom ufọdu iwu bayere ya: ha we zilaga ya na nwunye-ya na ihe nile nke ọ nwere.

Categories
JENESIS

JENESIS 13

1 Abram we si n’Ijipt rigo, ya onwe-ya, na nwunye-ya, na ihe nile ọ nwere, na Lot tiyere ya, rue Negeb.

2 Abram bu kwa ọgaranya nke-uku n’anu-ulo na n’ọla-ọcha, na n’ọla-edo.

3 O si na Negeb je na nbuli-ije-ya we rue Bet-el, rue ebe ahu ebe ulo-ikwū-ya diri site na nmalite, n’etiti Bet-el na Ai;

4 rue ọnọdu nke ebe-ichu-aja ahu nke ọ mereri n’ebe ahu na mbu: Abram we kpọkue aha Jehova n’ebe ahu.

5 Ọzọ kwa, Lot, onye ya na Abram nāyikọ je, ọ nwere igwè ewu na aturu, na igwè ehi, na ọtutu ulo-ikwū.

6 Ala ahu anagideghi ha, ibikọ n’otù: n’ihi na àkù-ha riri nne, ha apughi kwa ibikọ n’otù.

7 Ise-okwu we di n’etiti ndi-ọzùzù anu-ulo Abram na ndi-ọzùzù anu-ulo Lot: ndi Kenean na ndi-Perizait nēbi kwa n’ala ahu mb͕e ahu.

8 Abram we si Lot, Biko, ka ise-okwu ghara idi n’etiti mu na gi, na n’etiti ndi-ọzùzù anu-ulo nkem na ndi-ọzùzù anu-ulo nke gi; n’ihi na nwa-nne ka ayi bu.

9 Ala nka nile, ọ̀ dighi n’iru gi? biko, kewapu onwe-gi n’arum: ọ buru aka-ekpe, m’gēje kwa n’aka-nri: ma ọ buru aka-nri, m’gēje kwa n’aka-ekpe.

10 Lot we welie anya-ya abua, hu Gburugburu-ala nile nke Jọdan, na ala ahu nile bu ala miri nēdè nke-ọma, tupu Jehova ebibie Sọdọm na Gọmọra, dika ubi Jehova ab͕ara ogige, dika ala Ijipt, mb͕e i nēje Zoa.

11 Lot we rọputara onwe-ya Gburugburu-ala nile nke Jọdan; Lot we bulie ije je n’Iru-anyanwu: ha we kewapu onwe-ha otù n’aru nwa-nne-ya.

12 Abram biri n’ala kenean, ma Lot biri n’obodo nke Buruburu-ala ahu, ropu ulo-ikwū-ya je rue Sọdọm.

13 Ma ndi Sọdọm bu ndi ọjọ na ndi-nmehie megide Jehova nke-uku.

14 Ma Jehova siri Abram, mb͕e Lot kewapusiri onwe-ya n’ebe ọ nọ, Biko, welie anya-gi abua, si n’ọnọdu a, ebe gi onwe-gi nọ, le anya n’Ugwu na na Ndida na n’Iru-anyanwu na n’Ọdida-anyanwu:

15 n’ihi na ala nka nile nke gi onwe-gi nāhu anya, gi ka M’gēnye ya, nye kwa nkpuru-gi rue mb͕e ebighi-ebi.

16 M’gēme kwa ka nkpuru-gi di ka ájá nke ala: ya bu na, ọ buru na madu puru iguta ájá nke ala, agāguta kwa nkpuru-gi.

17 Bilie, jegharia n’ala nka n’ogologo-ya na n’obosara-ya; n’ihi na gi ka M’gēnye ya.

18 Abram we ropu ulo-ikwū-ya, bia biri n’etiti osisi terebinth nke Mamre, nke di nime Hebron, o wuere Jehova ebe-ichu-aja n’ebe ahu.

Categories
JENESIS

JENESIS 14

1 O rue, n’ubọchi nke Amrafel, bú eze Shaina, na nke Ariok, bú eze Elasa, na nke Kedoalaoma, bú eze Ilam, na nke Taidal, bú eze Goyim,

2 na ha buru agha megide Bira, bú eze Sọdọm, megide kwa Biasha, bú eze Gọmọra, na Shainab, bú eze Adma, na Shemiba, bú eze Zeboyim, na eze Bila (nke ahu bu Zoa).

3 Ndia nile jikọtara onwe-ha n’otù na ndagwurugwu Sidim (nke ahu bu Oké Osimiri Nnú).

4 Arọ iri na abua ka ha fere Kedoalaoma, n’arọ nke-iri-na-atọ ha we nupu isi.

5 N’arọ nke-iri-na-anọ Kedoalaoma we bia, ya na ndi-eze ndi ya na ha yikọrọ, ha tib͕ue Refaim n’Ashterot-Kanaim, na Zuzim nime Ham, na Imim nime Shave-kiriataim,

6 na ndi Hoa n’ugwu-ha, bú Sia, rue El-peran, nke di n’akuku ọzara.

7 Ha we chigharia, bia En-mishpat (nke ahu bu Kedesh), tib͕ue ndi bi n’ọhia nile nke ndi Amalek, tib͕u kwa ndi-Amorait, ndi bi na Hazazon-tema.

8 Eze Sọdọm na eze Gọmọra na eze Adma na eze Zeboyim na eze Bila (nke ahu bu Zoa) we pua, do agha n’usoro imegide ha nime ndagwurugwu Sidim;

9 imegide Kedoalaoma, bú eze Ilam, na Taidal, bú eze Goyim, na Amrafel, bú eze Shaina, na Ariok, bú eze Elasa; eze anọ megide eze ise ahu.

10 Ma ndagwurugwu Sidim bu nání olùlù olùlù nke bitumen; ndi-eze Sọdọm na Gọmọra we b͕alaga, da n’ebe ahu, ndi fọduru we b͕alaga n’ugwu.

11 Ha we chiri àkù nile nke Sọdọm na Gọmọra, na ihe-oriri-ha nile, la.

12 Ha chiri kwa Lot na àkù-ya la, bú nwa nwa-nne Abram, n’ihi na ya onwe-ya bi na Sọdọm.

13 Onye b͕apuru ab͕apu we bia gosi Abram, bú onye-Hibru: ma ya onwe-ya bi n’etiti osisi terebinth nke Mamre, bú onye-Amorait, nwa-nne Eshkol, na nwa-nne Ana; ndi ahu bu kwa ndi ha na Abram di n’ọb͕ub͕a-ndu.

14 Mb͕e Abram nuru na adọtara nwa-nne-ya n’agha, ọ chiputa ndi-ya eziri ibu agha, bú ndi amuru n’ulo-ya, ọgu iri-na-ise na iri na asatọ, ọ we nāchu ha rue Dan.

15 Ọ we kesa onwe-ya imegide ha n’abali, ya onwe-ya na ndi-orù-ya, o tib͕ue ha, chua ha rue Hoba, nke di n’aka-ekpe Damaskọs.

16 Ọ we chilata àkù nile, ọzọ kwa, Lot, bú nwa-nne-ya, na àkù-ya ka ọ chilatara, ndinyom kwa, na ndi ahu.

17 Eze Sọdọm we pua izute ya, mb͕e o siri na ntib͕u nke Kedoalaoma na ndi-eze ahu, bú ndi ya na ha yikọrọ, latasia, rue ndagwurugwu Shave (nke ahu bu Ndagwurugwu Eze).

18 Melkizedek, bú eze Selem, we buputa achicha na manya-vine: onye ahu bu kwa onye-nchu-aja diri Chineke Nke kachasi ihe nile elu.

19 Ọ we gọzie ya, si, Onye agọziri agọzi ka Abram bu site n’aka Chineke Nke kachasi ihe nile elu, bú Onye-nwe elu-igwe na uwa:

20 ọ bu kwa Onye agọziri agọzi ka Chineke Nke kachasi ihe nile elu bu, Onye raworo ndi nākpab͕u gi nye n’aka-gi. Ọ we nye ya otù uzọ n’uzọ iri nime ihe nile.

21 Eze Sọdọm we si Abram, Nyem nání nke bu madu, ma were àkù n’onwe-gi.

22 Abram we si eze Sọdọm, Eweliwom akam nye Jehova, bú Chineke Nke kachasi ihe nile elu, Onye-nwe elu-igwe na uwa,

23 na m’gaghi-ewere ihe ma-ọli nime ihe ọ bula nke i nwere, site n’ogho we rue eriri-akpukpọ-ukwu, ka i we ghara isi, Mu onwem emewo Abram ka ọ buru ọgaranya.

24 Ka ihe ọ bula ghara idirim: nání ihe nke umu-okorọbia ndia riri, na òkè nke ndikom ahu mu na ha yikọrọ je: Ana, na Eshkol, na Mamre, ka ha onwe-ha were òkè-ha.

Categories
JENESIS

JENESIS 15

1 Mb͕e ihe ndia gasiri, okwu Jehova ruru Abram nti n’ọhù, si, Atula egwu, Abram: Mu onwem bu ọta diri gi, ugwọ-ọlu-gi riri nne nke-uku.

2 Abram we si, Onye-nwe-ayi, bú Jehova, gini ka I gēnyem, ebe mu onwem gaje ib͕a aka nwa si n’uwa la, ma onye gēnweta ulom bu Damesek Elieza?

3 Abram si kwa, Le, mu ka I nēnyeghi nkpuru: le kwa, nwa-ulom bu onye nēnweta ihem.

4 Ma, le, okwu Jehova ruru ya nti, si, Nwoke a agaghi-enweta ihe-gi; kama onye gēsi n’afọ-gi puta, onye ahu gēnweta ihe-gi.

5 O me ka ọ puta n’èzí, Ọ si, Biko, legide anya n’ebe elu-igwe di, gua kpakpando, ọ buru na i puru igu ha: Ọ si ya, Otú a ka nkpuru-gi gādi.

6 Ọ we kwere na Jehova; Ọ we gua ya nye ya n’ezi omume.

7 Ọ si ya, Mu onwem bu Jehova Nke mere ka i si n’Ua nke ndi Kaldea puta, inye gi ala nka inweta ya.

8 Ọ si, Onye-nwe-ayi, bú Jehova, #m’gēji gini mara na m’gēnweta ya?

9 Ọ si ya, Chirim nwa-ab͕ọghọ-ehi nke b͕ara arọ atọ, na nne-ewu nke b͕ara arọ atọ, na ebulu nke b͕ara arọ atọ, na nduru, na nwa-kpalakwukwu.

10 O we chiri Ya ihe ndia nile, kpọwa ha n’etiti abua, tiye otù nkpọwa na ncherita-iru ibe-ya: ma ọ kpọwaghi nnunu abua ahu.

11 Udele we fedakwasi ozu-anu ahu, ma Abram chuliri ha.

12 O rue, mb͕e anyanwu gaje ida, na oké ura dakwasiri Abram; ma, le, oké ujọ, bú ọchichiri uku, nādakwasi ya.

13 Ọ si Abram, Mara nke-ọma na nkpuru-gi gābu ọbìa n’ala nābughi nke ha, ha gēfè kwa ha; ha gēweda ha ala nnù arọ;

14 ọzọ kwa, mba ahu nke ha gēfè ka M’ganēkpe ikpe: emesia ha gāchiri àkù uku puta.

15 Ma gi onwe-gi gālakuru nna-gi-hà n’udo; agēlì gi n’ezi isi-awọ.

16 Ma n’ọb͕ọ nke-anọ ka ha gālata n’ebe a: n’ihi na ajọ omume ndi-Amorait akēzughi.

17 O rue na, mb͕e anyanwu dasiri, mb͕e ọ b͕a-kwa-ra ọchichiri, le, ite-ọku nke nākwu anwuru, na ọwa nke nēnwu ọku nke gabigara n’etiti iberibe anu ahu.

18 N’ubọchi ahu ka Jehova b͕ara ọb͕ub͕a-ndu nye Abram, si, Nkpuru-gi ka M’nyeworo ala nka, site n’osimiri Ijipt rue osimiri uku ahu, bú osimiri Yufretis:

19 ndi-Kinait, na ndi-Kenizait, na ndi-Kadmonait,

20 na ndi Het, na ndi-Perizait, na Refaim,

21 na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Giagashait, na ndi Jebus.

Categories
JENESIS

JENESIS 16

1 Ma Serai, bú nwunye Abram, amughi nwa nye ya: ma ọ nwere otù nwayi nējere ya ozi, bú onye Ijipt, onye aha-ya bu Hega.

2 Serai we si Abram, Biko, le, Jehova eb͕ochiwom imu nwa; biko, bakuru nwayi nējerem ozi; eleghi anya agēsite na ya wuliem elu dika ulo. Abram we ge nti n’olu Serai.

3 Serai, bú nwunye Abram, we were Hega, bú onye Ijipt, bú nwayi nējere ya ozi, nye Abram, bú di-ya, na nwunye, n’ọgwugwu arọ nke-iri Abram biri n’ala Kenean.

4 O we bakuru Hega, o we turu ime: o we hu na ọ turu ime, ewe leda nwayi-nwe-ya n’anya-ya.

5 Serai we si Abram, Ihe-ikem di n’aru gi: mu onwem nyere nwayi nējerem ozi n’obi-gi; o we hu na ọ turu ime, ewe ledam n’anya-ya: ka Jehova kpe ikpe n’etiti mu na gi.

6 Abram we si Serai, Le, nwayi nējere gi ozi di n’aka-gi; me ya ihe di nma n’anya-gi. Serai we weda ya ala, o we b͕apu n’iru-ya.

7 Mọ-ozi nke Jehova we hu ya n’akuku isi-iyi miri ahu di n’ọzara, n’akuku isi-iyi ahu di n’uzọ Shua.

8 Ọ si, Hega, nwayi nējere Serai ozi, òle ebe i siri bia? ọ̀ bu kwa ole ebe i nēje? Ọ si, Ọ bu n’iru Serai, bú nwayi-nwem, ka m’nāb͕apu.

9 Mọ-ozi nke Jehova we si ya, Laghachikuru nwayi-nwe-gi, weda kwa onwe-gi ala n’okpuru aka-ya.

10 Mọ-ozi nke Jehova si kwa ya, M’gēme ka nkpuru-gi ba uba nke-uku, agaghi-aguta kwa ya n’ihi ọtutu ọ di.

11 Mọ-ozi nke Jehova si kwa ya, Le, gi onwe-gi di ime, i gaje imu nwa-nwoke; i gākpọ kwa aha-ya Ishmael, n’ihi na Jehova egewo nti na nweda-gi.

12 Ya onwe-ya gābu kwa madu yiri inyinya-ibu-ọhia; aka-ya gēmegide madu nile ọ bula, aka madu nile ọ bula gēmegide kwa ya; ọ bu kwa n’iru umu-nne-ya nile ka o gēbi.

13 Ọ we kpọ aha Jehova Nke nāgwa ya okwu, Gi onwe-gi bu Chineke nāhu uzọ: n’ihi na ọ siri, Ọ̀ bu kwa n’ebe a ka m’leworo azu Onye nāhum anya?

14 N’ihi nka ka akpọrọ ólùlù-miri ahu Bia-lahai-roi; le, ọ di n’etiti Kedesh na Bered.

15 Hega we muara Abram nwa-nwoke: Abram we kpọ aha nwa-ya nwoke, nke Hega muru, Ishmael.

16 Abram b͕ara ọgu arọ anọ na isi, mb͕e Hega muru Ishmael nye Abram.

Categories
JENESIS

JENESIS 17

1 Mb͕e Abram b͕ara ọgu arọ anọ na iri na iteghete, Jehova mere ka Abram hu Ya anya, Ọ si ya, Mu onwem bu Chineke Nke puru ime ihe nile; gi jegharia n’irum, buru kwa onye zuru okè.

2 M’gētiye kwa ọb͕ub͕a-ndum n’etiti Mu na gi, me ka i ba uba nke-uku nke-uku.

3 Abram we da kpu iru-ya n’ala: Chineke we kpayere ya uka, si,

4 Mu onwem, le, ọb͕ub͕a-ndum di n’ebe i nọ, i gāghọ kwa nna nke ìgwè mba.

5 Agaghi-akpọ kwa aha-gi Abram ọzọ, ma aha-gi gābu Abraham; n’ihi na nna nke ìgwè mba ka M’meworo gi.

6 M’gēme kwa ka i mua ọmùmù nke-uku nke-uku, M’gēme kwa ka i ghọ mba di iche iche, ndi-eze gēsi kwa nime gi puta.

7 M’gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n’etiti Mu na gi na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, rue ọb͕ọ-ha nile, ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M’gāburu gi, buru kwa nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, Chineke.

8 M’gēnye kwa gi, nye kwa nkpuru-gi gānọchi gi, ala ọnọdu-ọbìa-gi nile, bú ala Kenean nile, ka ọ buru ihe-onwunwe ebighi-ebi; M’gābu-kwa-ra ha Chineke.

9 Chineke we si Abraham, Gi onwe-gi kwa, i gēdebe ọb͕ub͕a-ndum, gi onwe-gi, na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, rue ọb͕ọ-ha nile.

10 Nka bu ọb͕ub͕a-ndum, nke unu gēdebe, nke di n’etiti Mu na unu na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi; agēbì nwa-nwoke ọ bula n’etiti unu úgwù.

11 Agēbì unu úgwù n’anu-aru nke apí-unu; ọ gābu kwa ihe-iriba-ama nke ọb͕ub͕a-ndu di n’etiti Mu na unu.

12 Agēbì onye ruru ubọchi asatọ úgwù n’etiti unu, nwa-nwoke ọ bula rue ọb͕ọ-unu nile, onye amuru n’ulo, na onye eji ego b͕ata n’aka onye ala ọzọ ọ bula, nke nēsighi na nkpuru-gi puta.

13 Aghaghi ibì onye amuru n’ulo-gi, na onye eji ego-gi b͕ata, úgwù: ọb͕ub͕a-ndum gādi kwa n’anu-aru-unu ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi.

14 Ma nwoke anēbighi úgwù, nke anēbighi úgwù n’anu-aru nke apí-ya, agēbipu nkpuru-obi ahu n’etiti umu-nna-ya; ọ mebiwo ọb͕ub͕a-ndum.

15 Chineke we si Abraham, Serai, bú nwunye-gi, i gaghi-akpọ aha-ya Serai, n’ihi na Sera bu aha-ya.

16 M’gāgọzi ya, ọzọ kwa, M’gēnye gi nwa-nwoke site na ya: M’gāgọzi kwa ya, ọ gāghọ kwa mba di iche iche; ndi-eze nke ndi di iche iche gēsite na ya di.

17 Abraham we da kpue iru-ya n’ala, chì kwa ọchì, si n’obi-ya, Ọ̀ bu onye b͕ara ọgu arọ ise ka agā-muru nwa? Sera kwa, nke b͕ara ọgu arọ anọ na iri, ọ̀ gāmu nwa?

18 Abraham we si Chineke, Biko, ka Ishmael di ndu n’iru Gi!

19 Chineke we si, Kama, Sera, bú nwunye-gi, gaje imuru gi nwa-nwoke; i gākpọ aha-ya Aisak: M’gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n’ebe ọ nọ, ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi nye nkpuru-ya gānọchi ya.

20 Ishmael kwa, anurum olu-gi bayere ya: le, agọziwom ya, M’gēme ka ọ mua ọmùmù, M’gēme kwa ka ọ ba uba nke-uku nke-uku; ndi-isi iri na abua ka ọ gāmu, M’gēme kwa ya ka ọ ghọ mba uku.

21 Ma ọb͕ub͕a-ndum ka M’gēme ka o guzosi ike n’ebe Aisak nọ, bú nke Sera gāmuru gi na mb͕e nka akara àkà gaeru.

22 Ọ we rapu ikpayere ya uka, Chineke we si n’ebe Abraham nọ rigo.

23 Abraham we chiri Ishmael, bú nwa-ya nwoke, na ndi nile amuru n’ulo-ya, na ndi nile eji ego-ya b͕ata, nwoke nile ọ bula n’etiti ndikom ulo Abraham, o bìe ha úgwù n’anu-aru nke apí-ha n’otù ubọchi ahu, dika Chineke kpayere ya uka.

24 Abraham b͕ara ọgu arọ anọ na iri na iteghete, mb͕e ebiri ya úgwù n’anu-aru nke apí-ya.

25 Ishmael, bú nwa-ya nwoke, b͕a-kwa-ra arọ iri na atọ, mb͕e ebiri ya úgwù n’anu-aru nke apí-ya.

26 N’otù ubọchi ahu ka ebiri Abraham na Ishmael nwa-ya nwoke úgwù.

27 Ọ bu kwa ya na ndikom ulo-ya nile, bú ndi amuru n’ulo, na ndi eji ego b͕ata n’aka ndi ala ọzọ, ka ebiri úgwù.

Categories
JENESIS

JENESIS 18

1 Jehova we me ka ọ hu Ya anya n’etiti osisi terebinth nke Mamre, mb͕e ya onwe-ya nānọdu n’ọnu-uzọ ulo-ikwū-ya n’ikpo-ọku nke ehihie;

2 o welie anya-ya abua elu, hu, ma, le, ndikom atọ nēguzo onwe-ha na ncherita-iru ya: mb͕e ọ huru ha, o si n’ọnu-uzọ ulo-ikwū ahu b͕a ọsọ izute ha, ọ kpọ isi ala,

3 si, Onye-nwem, biko, ọ buru na ahutawom amara n’iru gi, biko, esila n’ebe orù-gi nọ gabiga:

4 biko, ka ekute nwantī miri, unu sa ukwu-unu, zuru-kwa-nu ike n’okpuru osisi a:

5 ka m’weta kwa iberibe achicha, nwe-kwa-nu ume n’obi-unu; emesia gabi-ganu: n’ihi na ọ bu n’ihi nka ka unu gabigakutere orù-unu. Ha we si, Me otú a, dika i kwuru.

6 Abraham we me ngwa ba n’ulo-ikwū-ya, bakuru Sera, si, Me ngwa, weta mb͕é utu ọka flour atọ, gwọ ya, me ob͕e achicha.

7 Abraham we b͕aga n’ìgwè ehi ya, were nwa-ehi nke anu-aru-ya nākaghi aka nke di kwa nma, nye okorọbia nējere ya ozi; o me ngwa idozi ya.

8 O were kwa miri-ara-ehi nke raru araru, na miri-ara-ehi, na nwa-ehi ahu nke o doziri, o che ha n’iru ha; ya onwe-ya we nēguzo n’akuku ha n’okpuru osisi ahu, ha we rie.

9 Ha si ya, Òle ebe Sera, bú nwunye-gi, nọ? Ọ si, Le, ọ nọ n’ulo-ikwū.

10 Ọ si, Aghaghim ichigharikute gi dika mb͕e a n’arọ ọzọ; le kwa, Sera, bú nwunye-gi, gēnwe nwa-nwoke. Ma Sera nuru n’ọnu-uzọ ulo-ikwū, nke di n’azu ya.

11 Ma Abraham na Sera ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ha nāgwu; ọ ghawori idiri Sera dika ọ nādiri ndinyom.

12 Sera we chì ọchì nime onwe-ya, si, M’gēnwe ihe-utọ mb͕e m’kasiri nká, onye-nwem bu kwa agadi?

13 Jehova we si Abraham, Ọ̀ bu kwa n’ihi gini ka Sera chiworo ọchì, si, Ọ̀ gābu ezi-okwu na m’gāmu nwa, mb͕e mu onwem ghọworo agadi?

14 Ọ̀ di ihe kariri Jehova ime? Na mb͕e akara àkà ka M’gēchigharikute gi, dika mb͕e a aka-nile, Sera gēnwe kwa nwa-nwoke.

15 Sera we gọ, si, Achighm ọchì; n’ihi na ọ nātu egwù. Ọ si, É-è; kama i chiri ọchì.

16 Ndikom ahu we si n’ebe ahu bilie, le anya n’ebe Sọdọm di: Abraham nēso kwa ha je idupu ha.

17 Jehova we si, Mu onwem, M’nēzonari Abraham ihe Mu onwem nēme;

18 ebe Abraham nāghaghi ighọ mba di uku nwe kwa ume, agāgọzi kwa mba nile nke uwa nime ya?

19 N’ihi na amawom ya, ka o we nye umu-ya na ulo-ya, ndi gānọchi ya, iwu, ka ha we debe uzọ Jehova, ime ezi omume na ihe ekpere n’ikpe; ka Jehova we weta n’isi Abraham ihe O kwuru bayere ya.

20 Jehova we si, Iti-nkpu Sọdọm na Gọmọra, o riri nne n’ezie, nmehie-ha kwa, ọ di arọ́ nke-uku n’ezie;

21 ka M’rida kwa, hu ma ọ bu dika iti-nkpu ya si di, nke rurum nti, ka ha mezuworo; ọ buru kwa na ọ dighi otú a, ka M’mara.

22 Ndikom ahu we si n’ebe ahu che iru je n’uzọ Sọdọm: ma Abraham nēguzogide n’iru Jehova.

23 Abraham we biarue nso, si, Ọ̀ gābu ezie na I gēkpochapu ndi ezi omume tinyere ndi nēmebi iwu?

24 Eleghi anya ọgu ndi ezi omume abua na iri di n’obodo ahu: ọ̀ gābu ezie na i gēkpochapu ebe ahu ghara ib͕aghara ya n’ihi ọgu ndi ezi omume abua na iri nọ nime ya?

25 Ya buru Gi ihe-árú ime dika ihe a si di, ime ka onye ezi omume so onye nēmebi iwu nwua, o we buru na dika ndi ezi omume si di, otú a ka ndi nēmebi iwu di; ya buru Gi ihe-árú: Onye-ikpé uwa nile, Ọ̀ gaghi-eme ihe ekpere n’ikpe?

26 Jehova we si, Ọ buru na achọtam nime Sọdọm ọgu ndi ezi omume abua na iri n’etiti obodo ahu, M’gāb͕aghara ebe ahu nile n’ihi ha.

27 Abraham we za, si, Biko, le, ejisiwom ike igwa Onye-nwe-ayi okwu, mu onwem, nke bu ájá na ntu:

28 eleghi anya madu ise agaghi-adi n’ọgu ndi ezi omume abua na iri ahu: Ì gēbibi obodo ahu nile n’ihi madu ise ahu nādighi ya? Ọ si, M’gaghi-ebibi ya, ma M’chọta n’ebe ahu ọgu abua na ise.

29 Ọ gwa kwa Ya okwu ọzọ, si, Eleghi anya agāchọta n’ebe ahu ọgu abua. Ọ si, M’gaghi-eme ya n’ihi ọgu abua ahu.

30 Ọ si, Biko, ka Onye-nwe-ayi ghara iwe iwe di ọku, ka m’kwu kwa okwu: eleghi anya agāchọta n’ebe ahu orú na iri. Ọ si, M’gaghi-eme ya, ma M’chọta n’ebe ahu orú na iri.

31 Ọ si, Biko, le, ejisiwom ike igwa Onye-nwe-ayi okwu: eleghi anya agāchọta n’ebe ahu orú. Ọ si, M’gaghi-ebibi ya n’ihi orú ahu.

32 Ọ si, Biko, ka Onye-nwe-ayi ghara iwe iwe di ọku, ka m’kwu kwa okwu nání otù ub͕ò a: eleghi anya agāchọta n’ebe ahu iri. Ọ si, M’gaghi-ebibi ya n’ihi iri ahu.

33 Jehova we la, mb͕e Ọ gwabisiri Abraham okwu: Abraham we lata n’ọnọdu-ya.

Categories
JENESIS

JENESIS 19

1 Abua nime ndi-mọ-ozi ahu we biarue Sọdọm n’anyasi; ma Lot nānọdu n’ọnu-uzọ-ama Sọdọm: Lot we hu ha anya, bilie izute ha, ọ da kpue iru-ya n’ala,

2 si, Biko, le, ndi-nwem, biko, sinu n’ije-unu wezuga onwe-unu bà n’ulo orù-unu, nọ ọnọdu-abali, sa kwa ukwu-unu, unu gēbili n’isi-ututu, la, Ha si, É-è, kama ọ bu n’amá ka ayi gānọ ọnọdu-abali.

3 O rugide ha nke-uku; ha we si n’ije-ha wezuga onwe-ha jekuru ya, ba n’ulo-ya; O we mere ha oké oriri, sie achicha ekoghi-eko, ha rie.

4 Ma tutu ha edina, ndikom obodo ahu, bú ndikom Sọdọm, b͕ara ulo ahu buru-buru, ma okorọbia ma agadi, ndi ala ahu nile site n’akuku ọ bula;

5 ha we kpọ Lot òkù, si ya, Òle ebe ha nọ, bú ndikom ndi bakutere gi n’abali a? me ka ha putakute ayi, ka ayi we mara aru-ha.

6 Lot we pukuru ha rue ọnu-uzọ, mechie uzọ n’azu ya.

7 Ọ si, Biko, umu-nnem, unu emela ihe ọjọ.

8 Biko, le, enwerem umu-ndinyom abua ndi akāmaghi aru nwoke: biko, ka m’kuputara unu ha, me-kwa-nu ha dika ọ di nma n’anya-unu: nání unu emela ndikom ahu ihe; n’ihi na ọ bu n’ihi nka ka ha biara n’okpuru ndò nke ulom.

9 Ha si, Pua n’uzọ. Ha si kwa, Otù onye a batara inọ dika ọbia, ọ we nēkpe ikpe nke ukwu: ub͕u a ayi gēme gi ihe kari ihe ayi gēme ha. Ha we rugide nwoke ahu, bú Lot, nke-uku, biarue nso itiwa ibo-uzọ.

10 Ndikom ahu we setipu aka-ha, me ka Lot bakute ha n’ulo, ha we mechie uzọ.

11 Ha we were ikpu-ìsì tie ndikom ahu ndi nọ n’ọnu-uzọ ulo, ma onye ntà ma onye uku: ike we gwu ha ichọta ọnu-uzọ ahu.

12 Ndikom ahu we si Lot, Ọ̀ di onye i nwere n’ebe a ọzọ? di nwa-gi, na umu-gi ndikom, na umu-gi ndinyom, na onye ọ bula i nwere n’obodo a; me ka ha si n’ebe a pua:

13 n’ihi na ndi nēbibi ebe a ka ayi bu, n’ihi na iti-nkpu-ha aghọwo ihe uku n’iru Jehova; Jehova ezitewo kwa ayi ibibi ya.

14 Lot we pua, gwa di umu-ya, ndi nālu umu-ya ndinyom, okwu, si, Bilienu, si n’ebe a pua; n’ihi na Jehova nēbibi obodo a. Ma ọ di ka onye nākwa emò n’anya di umu-ya.

15 Ma mb͕e chi bọrọ, ndi-mọ-ozi ahu nukpọrọ Lot, si, Bilie, chiri nwunye-gi, na umu-gi ndinyom abua ndi ahuru n’ebe a; ka ewe ghara ikpochapu gi n’ahuhu ajọ omume obodo a.

16 Ma ọ b͕agwojuru ya anya; ndikom ahu we jide aka-ya, jide kwa aka nwunye-ya, jide kwa aka umu-ya ndinyom abua; n’ihi na Jehova nwere ọmiko n’aru ya: ha we me ka ọ puta, me ka ọ nọdu n’azu obodo.

17 O rue, mb͕e ha mesiri ka ha puta n’azu obodo, na ọ siri, Wepuga onwe-gi n’ihi ndu-gi; elekwala anya n’azu gi, eguzokwala na Gburugburu-ala a nile; wepuga onwe-gi je ugwu ahu, ka ewe ghara ikpochapu gi.

18 Lot we si ha, É-è, biko, onye-nwem:

19 biko, le, orù-gi ahutawo amara n’iru gi, i mewo kwa ka ebere-gi di uku, nke i meworom n’idebem ndu; mu onwem apughi kwa iwepuga onwem je ugwu, ka ihe ọjọ ahu we ghara irapara n’arum, m’we nwua:

20 biko, le, obodo a di nso ib͕alaga n’ebe ahu, nke ahu bu kwa obodo ntà: biko, ka m’wepuga onwem je ebe ahu, (ọ̀ bughi obodo ntà?) nkpuru-obim gādi kwa ndu.

21 Ọ si ya, Le, m’huwo kwa gi iru-ọma n’okwu a, na m’gaghi-akwatu obodo a nke i kwuworo okwu bayere ya.

22 Me ngwa, wepuga onwe-gi je ebe ahu; n’ihi na apughm ime ihe rue mb͕e i gābà n’ebe ahu. N’ihi nka ka akpọrọ aha obodo ahu Zoa.

23 Anyanwu awawo n’elu uwa mb͕e Lot batara nime Zoa.

24 Jehova we me ka brimstone na ọku si n’elu-igwe zokwasi Sọdọm na Gọmọra dika miri site n’ebe Jehova nọ;

25 O we kwatue obodo ndia, na Buruburu-ala ahu nile, na ndi nile bi n’obodo ahu nile, na ihe-opupú nke ala.

26 Ma nwunye-ya siri n’azu Lot leghachi anya n’azu, we ghọ ogidi nnú.

27 Abraham we bilie n’isi-ututu je ebe ahu nke o guzorori n’iru Jehova:

28 ọ le anya n’ebe Sọdọm na Gọmọra di, na n’ebe ala nile nke Buruburu-ala ahu di, ọ we hu, ma, le, anwuru-ọku nke ala ahu rigoro dika anwuru-ọku nke oké ọku.

29 O rue, mb͕e Chineke bibiri obodo nile nke Buruburu-ala ahu, na Chineke chetara Abraham, we si n’etiti nkwatu ahu zipu Lot, mb͕e Ọ kwaturu obodo nke Lot biri nime ha.

30 Lot we si na Zoa rigo, biri n’ugwu ahu, ya na umu-ya ndinyom abua; n’ihi na ọ turu egwu ibi nime Zoa: ọ we biri n’ọb͕à, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom abua.

31 Ada we si nke-ntà, Nna-ayi aghọwo agadi, ma ọ dighi nwoke n’uwa ibakute ayi, dika uzọ uwa nile si di:

32 bia, ka ayi me nna-ayi ka ọ ṅua manya-vine, ka ayi na ya dina kwa, ka ayi we site na nna-ayi debe nkpuru ndu.

33 Ha we me ka nna-ha ṅua manya-vine n’abali ahu: ada we ba, ya na nna-ya we dina; ma nna-ya amaghi mb͕e o dinara, na mb͕e o biliri.

34 O rue n’echi-ya, na ada siri nke-ntà, Le, mu na nnam dinara n’abali nyahuru: ka ayi me ka ọ ṅu kwa manya-vine n’abali a; gi ba kwa, gi na ya dina, ka ayi we site na nna-ayi debe nkpuru ndu.

35 Ha we me ka nna-ha ṅu kwa manya-vine n’abali ahu: nke-ntà we bilie, ya na nna-ya we dina; ma nna-ya amaghi mb͕e o dinara, na mb͕e o biliri.

36 Umu Lot ndinyom abua we turu ime site n’aka nna-ha.

37 Ada we mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Moab: onye ahu bu nna ndi Moab rue ta.

38 Nke-ntà kwa, ya onwe-ya mu-kwa-ra nwa-nwoke, kpọ aha-ya Ben-ami: onye ahu bu nna umu Amon rue ta.

Categories
JENESIS

JENESIS 20

1 Abraham we si n’ebe ahu bulie ije n’uzọ ala Negeb, biri n’etiti Kedesh na Shua; ọ we nọ dika ọbìa nime Gera.

2 Abraham we kwue okwu bayere Sera, bú nwunye-ya, si, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu: Abimelek, bú eze Gera, we zìe ozi, kuru Sera.

3 Ma Chineke biakutere Abimelek na nrọ nke abali, si ya, Le, gi bu onye nwuru anwu, n’ihi nwayi ahu nke i kuruworo; n’ihi na nwayi ahu bu nwunye di luru.

4 Ma Abimelek akābiaghi nso ya: ọ we si, Onye-nwe-ayi, Ọ̀ bu kwa mba nke nēme ezi omume ka I gēb͕u?

5 Ọ̀ bughi nwoke ahu sirim, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu? nwayi ahu kwa, ọbuná ya onwe-ya siri, Nwa-nnem nwoke ka ọ bu: n’izu-okè nke obim na n’emeghi-ihe-ọjọ nke ọbu-akam abua ka m’meworo nka.

6 Chineke we si ya nime nrọ ahu, Mu onwem kwa, amawom na ọ bu n’izu-okè nke obi-gi ka i meworo nka, Mu onwem we b͕ochi kwa gi ka i ghara ime-hie megidem: n’ihi ya ekweghm i metu ya aka.

7 Ma ub͕u a me ka nwunye nwoke ahu laghachi; n’ihi na onye-amuma ka ọ bu, ọ gēkpe kwa ekpere bayere gi, i we di ndu: ma ọ buru na i meghi ka ọ laghachi, gi mata na i ghaghi inwu anwu, gi onwe gi, n’ihe nile inwere.

8 Abimelek we bilie n’isi-ututu, kpọ ndi-orù-ya nile, kwue okwu ndia nile na nti-ha: ndikom ahu we tua egwu nke-uku.

9 Abimelek we kpọ Abraham, si ya, Gini bu ihe i meworo ayi? gini bu kwa ihe m’mehie-woro megide gi, na i mewo ka nmehie uku biakwasim, biakwasi kwa ala-ezem? omume nke nēkwesighi ime ka imeworo m.

10 Abimelek si kwa Abraham, Gini ka i huru, na i mewo ihe a?

11 Abraham we si, N’ihi na asirim, N’ezie ọ dighi egwù Chineke di n’ebe a; ha gēb͕ukwam n’ihi okwu bayere nwunyem.

12 Ọzọ kwa, ọ bu nwa-nnem nwayi n’ezie, nwa-nwayi nnam ka ọ bu, ọ bu nání na ọ bughi nwa-nwayi nnem; ọ we ghọrọm nwunye:

13 o rue, mb͕e Chineke merem ka m’si n’ulo nnam waghari, na asirim ya, Nka bu ebere-gi nke i gēmerem; n’ebe nile ọ bula nke ayi gābiaru ebe ahu, gi kwue okwu bayerem, si, Nwa-nnem nwoke ka ọ bu.

14 Abimelek we chiri ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, na orù-ndikom na ndinyom nēje ozi, nye Abraham, me kwa ka Sera nwunye-ya laghachikute ya.

15 Abimelek we si, Le, alam di n’iru gi: biri n’ebe di nma n’anya-gi.

16 Ọ si Sera, Le, enyewom nwa-nne-gi nnù nkpuru-ego ọla-ọcha abua na ọgu iri: le, nke ahu buru gi ihe-nkpuchi anya n’ebe ndi nile nọ, bú ndi gi na ha nọ; ọ bu kwa n’iru madu nile ka emeziworo gi.

17 Abraham we kpere Chineke: Chineke we me ka aru di Abimelek na nwunye-ya na orù-ya ndinyom nma; ha we mua umu.

18 N’ihi na Jehova b͕ochisiri àkpà-nwa nile nke ulo Abimelek ike, n’ihi okwu bayere Sera, bú nwunye Abraham.