Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 18

1 Ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, bú ebo Livai nile, ọ dighi òkè ma-ọbu ihe-nketa ha gēsoro Israel nwe: àjà-ọku nile nke Jehova na ihe-nketa-Ya ka ha gēri.

2 Ọ dighi kwa ihe-nketa ha gēnwe n’etiti umu-nne-ha: Jehova onwe-ya bu ihe-nketa-ha, dika Ọ gwaworo ha.

3 Nka bu kwa ihe ekpeziri ka enye ndi-nchu-àjà site n’aka ndi Israel, bú site n’aka ndi nāchu àjà, ma ọ bu ehi-ma-ọbu aturu, na ha gēnye onye-nchu-àjà ọkwa-aka-ya, na ǹtì-ya abua, na okwurù-ya.

4 Ihe mbu nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, na ihe mbu nke aji ìgwè ewu na aturu-gi, ka i gēnye ya.

5 N’ihi na Jehova, bú Chineke-gi, arọputawo ya n’ebo-gi nile, iguzo ije ozi n’aha Jehova, ya onwe-ya na umu-ya ndikom ubọchi-gi nile.

6 Mb͕e onye Livai gābia site n’otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile site n’Israel nile, ebe ya onwe-ya nọ dika ọbìa, ọ we were agu nile nāgu nkpuru-obi-ya biarue ebe ahu nke Jehova gārọputa;

7 ọ gēje kwa ozi n’aha Jehova, bú Chineke-ya, dika umu-nne-ya nile, bú ndi Livai, ndi nēguzo n’ebe ahu n’iru Jehova.

8 Òkè dika òkè-ya ka ha gēri, nāgughi ihe-ya nile erere nke o nwetara n’aka nna-ya-hà.

9 Mb͕e gi onwe-gi nābà n’ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, amutala ime dika ihe-árú nile nke mba ahu nile si di.

10 Agaghi-ahuta n’etiti gi onye nēme ka nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwayi gabiga nime ọku, ma-ọbu onye nāju ase, ma-ọbu onye nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, ma-ọbu onye nāb͕a afa, ma-ọbu onye-mb͕asi,

11 ma-ọbu dibia nrafu, ma-ọbu onye nāju mọ ihe, ma-ọbu dibia-afa, ma-ọbu onye nāju ndi nwuru anwu ihe.

12 N’ihi na ihe-árú nke Jehova ka onye ọ bula nke nēme ihe ndia bu: ọ bu kwa n’ihi ihe-árú ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nānapu ha ala-ha n’iru gi.

13 Onye zuru okè ka i gābu n’ebe Jehova, bú Chineke-gi, nọ.

14 N’ihi na mba ndia, nke gi onwe-gi gēnweta, nēge nti ndi nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, na ndi nāju ase: ma gi onwe-gi, ọ bughi otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi.

15 Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka onye-amuma, nke di ka mu onwem, biliere gi site n’etiti gi, site n’umu-nne-gi; onye ahu ka unu gēge nti;

16 dika ihe nile si di nke i riọrọ n’aka Jehova, bú Chineke-gi, na Horeb n’ubọchi nkpọkọta ahu, si, Ka m’ghara inu kwa olu Jehova, bú Chinekem, ọzọ, ka m’ghara kwa ihu ọku uku a ọzọ, ka m’we ghara inwu.

17 Jehova we sim, Ha ekwuwo nke-ọma okwu nke ha kwuworo.

18 M’gēme ka onye-amuma, nke di ka gi, biliere ha site n’etiti umu-nne-ha; M’gētiye kwa okwum nile n’ọnu-ya, ọ gāgwa kwa ha okwu nile nke M’gēnye ya n’iwu.

19 O gēru kwa, na nwoke ọ bula nke nāgaghi-ege nti okwum nile nke ọ gēkwu n’aham, Mu onwem gājuta ya n’aka ya.

20 Ma onye-amuma nke gēwere nganga kwu okwu n’aham, nke M’nēnyeghi ya iwu ikwu, ma-ọbu nke gēkwu n’aha chi di iche iche ọzọ, onye-amuma ahu gānwu kwa.

21 Mb͕e i gāsi n’obi-gi, Àyi gēsi aṅa mara okwu ahu nke Jehova nēkwughi?

22 Okwu nke onye-amuma nēkwu n’aha Jehova, ma okwu ahu emeghi, o reghi kwa; nke ahu bu okwu nke Jehova nēkwugh: na nganga ka onye-amuma ahu kwuworo ya, atula ujọ ya.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 19

1 Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēbipu mba ahu, ndi Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ala-ha, i we napu ha ala-ha, we biri n’obodo nile ha, na n’ulo nile ha;

2 i gākpaputara onwe-gi obodo atọ n’etiti ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ka i we nweta ya.

3 I gēdoziri onwe-gi uzọ, kè kwa ókè-ala nke ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēme gi ka i keta, uzọ atọ, ka ob͕u-madu ọ bula we b͕alaga n’ebe ahu.

4 Nka bu kwa okwu bayere ob͕u-madu, nke gāb͕alaga n’ebe ahu, we di ndu: onye nēb͕u madu-ibe-ya n’amaghi-ama, ma ya onwe-ya akpọghi ya asì na mb͕e gara aga;

5 dika mb͕e ya na ibe-ya nābà n’oké ọhia ikpọwa nkú, aka-ya we fé anyu-ike ib͕utu osisi, anyu-ike, bú ígwè, we b͕upu n’osisi ahu, we rue madu-ibe-ya aru, o we nwua; onye ahu gāb͕alaga n’otù nime obodo ndia, we di ndu:

6 ka onye-ọ́bọ̀ ọbara we ghara ichu ob͕u-madu ahu n’azu, mb͕e obi-ya di ọku, o we rue ya aru, n’ihi na uzọ di anya, ọ we tipu ndu-ya; ma ikpe ọnwu amaghi ya, n’ihi na ọ kpọghi ya asì na mb͕e gara aga.

7 N’ihi nka ka mu onwem nēnye gi iwu, si, I gākpaputara onwe-gi obodo atọ.

8 Ọ buru kwa na Jehova, bú Chineke-gi, eme ókè-ala-gi ka ọ sa mbara, dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi, O we nye gi ala ahu nile nke O kwuru, si na Ọ gēnye nna-gi-hà;

9 mb͕e i gēdebe ihe nile a enyere n’iwu, bú nke mu onwem nēnye gi n’iwu ta, ime ya, ihu Jehova, bú Chineke-gi, n’anya, na ije ije n’uzọ-Ya nile ubọchi-gi nile; i gātukwasi-kwa-ra onwe-gi obodo atọ ọzọ n’obodo atọ ndia:

10 ka ewe ghara iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ n’etiti ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa, ọbara we dikwasi gi n’isi.

11 Ma mb͕e nwoke ọ bula bu onye nākpọ madu-ibe-ya asì, o we che ya anwu, bilie megide ya, tipu ndu-ya, o we nwua; ob͕u-madu ahu we b͕alaga n’otù nime obodo ndia:

12 ndi-okenye obodo-ya gēzì kwa kpọputa ya n’ebe ahu, were ya nye n’aka onye-ọ́bọ̀ ọbara, ka o we nwua.

13 Anya-gi agaghi-emere ya ebere, ma i gēkpochapu n’Israel ọbara nke onye nēmeghi ihe ọjọ, ka o we diri gi nma.

14 Ewezugala ókè-ala ab͕ata-obi-gi, nke ndi mbu akpawo, n’ihe-nketa-gi nke i gēketa, n’ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka i nweta ya.

15 Nání otù onye-àmà agaghi-ebili imegide onye ọ bula bayere ajọ omume ọ bula, ma-ọbu bayere nmehie ọ bula, nime nmehie ọ bula nke ọ nēmehie: n’ọnu ndi-àmà abua, ma-ọbu n’ọnu ndi-àmà atọ, ka okwu gēguzosi ike.

16 Mb͕e onye-àmà nke ihe-ike gēbili megide onye ọ bula ib͕agide ya àmà bayere nwezuga;

17 ndikom abua ahu, ndi ise-okwu ahu diri, gēguzo n’iru Jehova, n’iru ndi-nchu-àjà na ndi-ikpé ndi gānọ na mb͕e ahu;

18 ndi-ikpé gaju kwa ase nke-ọma: ma, le, asi na onye-àmà ahu bu onye-àmà ugha, nke b͕agideworo nwa-nne-ya àmà ugha;

19 unu gēme kwa ya, dika o zubere ime nwa-nne-ya; i we kpochapu ihe ọjọ ahu n’etiti gi.

20 Ndi fọduru gānu kwa, tu kwa egwu, ha agaghi-eme kwa dika ihe ọjọ a si di ọzọ n’etiti gi.

21 Anya-gi agaghi-eme ebere; ndu lara ndu, anya lara anya, ezé lara ezé, aka lara aka, ukwu lara ukwu.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 20

1 Mb͕e i nāpù ibuso ndi-iro-gi agha, i we hu inyinya, na ub͕o-ala, na ndi bara uba kari gi, atula egwu ha: n’ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi, Onye nēme ka i si n’ala Ijipt rigoputa.

2 O gēru kwa, mb͕e unu nābiaru nso agha ahu, na onye-nchu-àjà gābiaru nso gwa ndi Israel okwu,

3 si ha, Nuru, Israel, unu onwe-unu nābiaru nso agha ta imegide ndi-iro-unu: ka obi-unu ghara ilọ unu miri; unu atula egwu, unu akuja-kwa-la akuja, unu ama-kwa-la jijiji n’iru ha;

4 n’ihi na Jehova, bú Chineke-unu, bu onye nēso unu je, iburu unu agha megide ndi-iro-unu, ka O we zọputa unu.

5 Ndi-ọchi-agha gāgwa ndi Israel okwu, si, Ònye bu nwoke nke wuworo ulo ọhu, ma ọ kāraghi ya nye Chineke? ya je laghachi n’ulo-ya, ka ọ ghara inwu n’agha, nwoke ọzọ ewe ra ya nye Chineke.

6 Ònye bu kwa nwoke nke kuworo ubi-vine, ma ọ kēmeghi ka ọ pua na nsọ anāsọ ya? ya je laghachi n’ulo-ya, ka ọ ghara inwu n’agha, nwoke ọzọ ewe me ka ọ pua na nsọ anāsọ ya.

7 Ònye bu kwa nwoke nke kwere ilu nwayi, ma o kēkubataghi ya? ya je laghachi n’ulo-ya, ka ọ ghara inwu n’agha, nwoke ọzọ ewe kubata ya.

8 Ndi-ọchi-agha gāgwa kwa ndi Israel okwu ọzọ, si, Ònye bu nwoke nke nātu egwu, nke obi nālọ kwa ya miri? ya je laghachi n’ulo-ya, ka obi umu-nne-ya we ghara imebi dika obi-ya.

9 O gēru kwa, mb͕e ndi-ọchi-agha gwabisiri ndi Israel okwu, na ha gēme ndi-isi nke usu nile nke ndi-agha ka ha buru ndi-nlekọta nēlekọta ndi Israel.

10 Mb͕e i nābiaru nso obodo ibuso ya agha, i gākpọ kwa ya òkù udo.

11 O gēru kwa, ọ buru na ọ za gi okwu udo, meghe-kwa-ra gi uzọ-ya, ọ gēru kwa, na ndi nile anāhuta nime ya gāghọrọ gi ndi nēfè òfùfè, ha gēfè kwa gi òfùfè.

12 Ma ọ buru na ọ kweghi ka gi na ya di n’udo, kama ọ nēbuso gi agha, i gānọchigide kwa ya n’agha:

13 Jehova, bú Chineke-gi, gēnye kwa ya n’aka-gi, i gēwere kwa ọnu mma-agha tib͕ue nwoke-ya ọ bula:

14 nání na i gālutara onwe-gi ndinyom, na umu-ntakiri, na anu-ulo, na ihe nile nke di n’obodo ahu, n’agha, bú ihe-nkwata-ya nile; i gēri kwa ihe-nkwata ndi-iro-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi.

15 Otú a ka i gēme obodo nile nke dipuru gi anya nke-uku, nke nādighi nime obodo nile nke mba ndia.

16 Ma emela ka ihe ọ bula nke nēku ume di ndu site n’obodo nile nke ndi ndia nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ha buru ihe-nketa.

17 N’ihi na i ghaghi iwezuga ka ha ebibie ha; bú ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus; dika Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi iwu:

18 ka ha we ghara izí unu ime dika ihe-árú-ha nile si di, nke ha meworo chi nile ha; unu ewe mehie megide Jehova, bú Chineke-unu.

19 Mb͕e i gānọchigide obodo n’agha ọtutu ubọchi, n’ibuso ya agha iwere ya, ebibila osisi-ya n’ifekwasi ha anyu-ike; n’ihi na ọ bu ihe sitere na ha ka i gēri, eb͕utu-kwa-la ha; n’ihi na osisi nke di n’ọhia, ọ̀ bu madu, ibà n’iru gi na nnọchigide-n’agha ahu?

20 Nání osisi nke i mara na ọ dighi osisi ihe-oriri ha bu, osisi ahu ka i gēbibi b͕utu kwa ha; i gēwu kwa ihe-nnọchigide-n’agha imegide obodo ahu nke nēbuso gi agha, rue mb͕e ọ dara.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 21

1 Mb͕e agāhuta otù onye eb͕uru eb͕u ka ọ dara n’ọhia n’ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka i we nweta ya, ma amaghi onye tib͕uru ya:

2 ndi-okenye-gi na ndi-ikpé-gi gāputa kwa, tùrue obodo nile nke di buruburu onye ahu eb͕uru eb͕u:

3 ọ gēru kwa, na obodo ahu nke dikachasiri nso onye ahu eb͕uru eb͕u, ndi-okenye obodo ahu gēwere kwa nwa-ab͕ọghọ-ehi nke ìgwè ehi, nke akējighi ya lu ọlu-ubi, nke akādọghi kwa ihe nime yoke;

4 ndi-okenye obodo ahu gākpudata nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu nime ndagwurugwu miri nērù mbe nile, nke anālughi ọlu-ubi, nke anāghaghi kwa nkpuru nime ya, ha gāb͕aji kwa olu nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu n’ebe ahu nime ndagwurugwu ahu:

5 ndi-nchu-àjà, bú umu Livai, gābiaru kwa nso; n’ihi na ha ka Jehova, bú Chineke-gi, rọputaworo ijere Ya ozi, na igọzi n’aha Jehova; ọ bu kwa dika okwu-ọnu-ha si di ka ise-okwu ọ bula na otiti-ihe ọ bula gādi:

6 ndi-okenye nile nke obodo ahu, ndi nọkachasiri nso onye ahu eb͕uru eb͕u, gākwọ kwa aka-ha n’elu nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu nke ab͕ajiri olu-ya nime ndagwurugwu ahu.

7 Ha gāza kwa, si, Aka-ayi awusighi ọbara nka, anya-ayi ahughi kwa ya.

8 Jehova, kpuchiere ndi-Gi nmehie-ha, bú Israel, nke I b͕aputaworo, ekwela ka ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ di n’etiti ndi-Gi, bú Israel. Agēkpuchi-kwa-ra ha nmehie ọbara ahu.

9 Gi onwe-gi gēkpochapu kwa n’etiti gi ọbara nēmeghi ihe ọjọ, mb͕e i gēme ihe ziri ezi n’anya Jehova.

10 Mb͕e i nāpu ibuso ndi-iro-gi agha, Jehova, bú Chineke-gi, we nye ha n’aka-gi, i we dọta usu ndi-ha adọtara n’agha n’agha,

11 i we hu nwayi nke mara nma n’aru n’usu ndi adọtara n’agha, ihe-ya we di gi ezi utọ, i we lutara ya onwe-gi na nwunye;

12 i gēme kwa ka ọ bata n’etiti ulo-gi; ọ gākọpu kwa isi-ya, mezie mbọ-aka-ya,

13 yipu uwe ndọta-n’agha-ya n’aru ya, nọdu n’ulo-gi, kwara nna-ya na nne-ya ogologo otù ọnwa: emesia i gābakuru ya, we ghọrọ ya di, ọ we ghọrọ gi nwunye.

14 O gēru kwa, ọ buru na ihe-ya atọghi gi utọ, na i gēzipu ya dika nkpuru-obi-ya si achọ; ma erela ya n’ego ma-ọli, emela ya dika orù, n’ihi na i wedawo ya n’ala.

15 Mb͕e nwoke nwere ndinyom abua, ma otù nime ha bu nwayi anāhu n’anya, nke-ọzọ aburu nwayi anākpọ asì, asi kwa na ha amuworo ya umu-ndikom, ma nwayi anāhu n’anya ma nwayi anākpọ asì; ma ọkpara bu nwa nwayi anākpọ asì muru;

16 ọ gēru kwa, n’ubọchi mb͕e ọ nēme ka umu-ya ndikom keta ihe o nwere, na ọ pughi ime ka nwa-nwoke nke nwayi anāhu n’anya buru ọkpara n’iru nwa-nwoke nke nwayi anākpọ asì, bú ọkpara:

17 kama ọ gēkwe na ọkpara ka ọ bu, bú nwa-nwoke nke nwayi anākpọ asì, n’inye ya òkè abua n’ihe ọ bula ahutara n’aka-ya: n’ihi na nwa ahu bu nkpuru mbu nke ume-ya; ọ bu ya nwe ihe ekpeziri ọnọdu-ọkpara.

18 Mb͕e nwoke nwere nwa-nwoke nēwezuga onwe-ya, nānupu kwa isi, nke nāgaghi-ege nti n’olu nna-ya, na n’olu nne-ya, ha we dọ ya aka na nti, ma ọ geghi ha nti:

19 nna-ya na nne-ya gējide kwa ya aka, me ka ọ pukuru ndi-okenye obodo-ya, we rue ọnu-uzọ-ama ebe nke ya;

20 ha gāsi kwa ndi-okenye obodo-ya, Nwa-ayi nka nēwezuga onwe-ya, nānupu kwa isi, ọ dighi-ege nti n’olu-ayi; ọ bu onye-nmefu, na onye nāṅubiga manya okè.

21 Ndikom nile nke obodo-ya gēwere nkume tub͕ue ya, ka ọ we nwua: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n’etiti gi; Israel nile gānu kwa, we tua egwu.

22 Mb͕e nmehie di n’onye ọ bula, bú ihe eji ma ya ikpe ọnwu, ewe me ka ọ nwua, i we kwuba ya n’osisi;

23 ozu-ya agaghi-adigide n’elu osisi abali nile, kama i ghaghi ilì ya n’ubọchi ahu; n’ihi na ihe-nkọcha nke Chineke ka onye a kwugburu akwugbu bu; ka i ghara imeru ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 22

1 I gaghi-ahu ehi nwa-nne-gi, ma-ọbu aturu-ya, nke nāchọ ifu efu, we zopu onwe-gi n’ebe ha di: i ghaghi iwere ha nyeghachi nwa-nne-gi.

2 Ma ọ buru na nwa-nne-gi anọghi gi nso, ọ buru kwa na i maghi ya, i gēwebata kwa ya n’etiti ulo-gi, ọ gādi kwa n’aka-gi rue mb͕e nwa-nne-gi gāju ase ya, i we were ya nyeghachi ya.

3 Otú a ka i gēme-kwa-ra inyinya-ibu-ya; otú a ka i gēme-kwa-ra uwe-nb͕okwasi-ya; otú a ka i gēme-kwa-ra ihe ọ bula furu efu nke nwa-nne-gi, nke nēfunari ya, ma i hutawo ya: i pughi izo onwe-gi.

4 I gaghi-ahu inyinya-ibu nwa-nne-gi ma-ọbu ehi-ya ka ha nāda n’uzọ, we zopu onwe-gi n’ebe ha di: i ghaghi isoro ya ibuli ha elu.

5 Ihe diri nwoke agaghi-adikwasi n’aru nwayi, nwoke agaghi-eyiri kwa uwe-nb͕okwasi nwayi: n’ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka onye ọ bula bu nke nēme ihe ndia.

6 Mb͕e akwu nnunu di n’iru gi n’uzọ, n’osisi ọ bula, ma-ọbu n’ala, umu-nnunu ma-ọbu àkwá adi kwa nime ya, nne ekpukwasi kwa umu-ya ma-ọbu àkwá-ya, ewela nne na umu-ya:

7 i ghaghi íme ka nne-nnunu la, ma umu-ya ka i gēwere n’onwe-gi; ka o we diri gi nma, ka i we me kwa ka ubọchi-gi di anya.

8 Mb͕e i nēwu ulo ọhu, i gēme-kwa-ra elu-ulo-gi ihe-nb͕ochi buruburu, ka i ghara ime ka ọbara di n’ulo-gi, mb͕e madu gēsi na ya da.

9 Aghala uzọ nkpuru abua n’ubi-vine-gi: ka ojuju nke nkpuru i nāgha na ihe-ọmume ubi-vine-gi we ghara idi nsọ.

10 Ejikọla ehi na inyinya-ibu idọ ihe eji gwu ala-ubi.

11 Eyila uwe nke eji uzọ ihe abua kpakọta, bú aji-anu na flax n’otù.

12 I gēmere onwe-gi ihe-ogho akpara akpà n’elu usọ anọ nke ihe-nb͕okwasi-gi, bú nke i ji b͕okwasi onwe-gi.

13 Mb͕e nwoke gāluru nwunye, bakuru ya, kpọ ya asì,

14 we bo ya ebubo ihere, we weta aha ọjọ n’isi ya, si, Nwayi a ka m’luru na nwunye, m’we biarue ya nso, ma achọtaghm n’aru ya ihe nēgosi na ọ bu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke:

15 nna nwa-ab͕ọghọ ahu, na nne-ya, gēwere kwa ihe nēgosi na nwa-ab͕ọghọ ahu bu onye nāmaghi nwoke, ha gēweputa-kwa-ra ha ndi-okenye obodo, rue ọnu-uzọ-ama:

16 nna nwa-ab͕ọghọ ahu gāsi kwa ndi-okenye ahu, Nwam nwayi ka m’nyere nwoke a na nwunye, o we kpọ ya asì;

17 ma, le, nwoke a ebowo ya ebubo ihere, si, Achọtaghm n’aru nwa-gi nwayi ihe nēgosi na ọ bu nwayi nāmaghi nwoke; ma ndia bu ihe nēgosi na nwam nwayi bu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Ha gāb͕asa kwa uwe-nb͕okwasi-ya n’iru ndi-okenye obodo ahu.

18 Ndi-okenye obodo ahu gēwere nwoke ahu dọ ya aka na nti;

19 ha gēri kwa ya nra ọgu shekel ọla-ọcha ise, nye nna nke nwa-ab͕ọghọ ahu, n’ihi na o wetawo aha ọjọ n’isi nwa-ab͕ọghọ nke Israel nāmaghi nwoke: ya ka ọ gābu-kwa-ra nwunye; ọ pughi ichupu ya ubọchi-ya nile.

20 Ma ọ buru na ihe a bu, ezi-okwu, na achọtaghi n’aru nwa-ab͕ọghọ ahu ihe nēgosi na ọ bu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke:

21 ha gēme kwa ka nwa-ab͕ọghọ ahu putarue ọnu-uzọ ulo nna-ya, ndikom obodo-ya gēwere nkume tub͕ue ya ka ọ we nwua: n’ihi na o mere ihe-nzuzu n’Israel, ikwa iko n’ulo nna-ya: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n’etiti gi.

22 Mb͕e agāhuta nwoke ka ya na nwayi nēdina, bú nwayi nke di lutaworo, ha abua gānwu kwa, bú nwoke ahu nke ya na nwayi ahu nēdina, na nwayi ahu: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n’Israel.

23 Mb͕e nwa-ab͕ọghọ di nke bu nwayi nāmaghi nwoke, nke nwoke kwere ilu, ma nwoke hutara ya n’obodo, we soro ya dina;

24 unu gēme kwa ka ha abua putarue ọnu-uzọ-ama obodo ahu, unu gēwere nkume tub͕ue ha, ka ha we nwua; nwa-ab͕ọghọ ahu, n’ihi na o tighi nkpu n’obodo: na nwoke ahu, n’ihi na o wedawo nwunye madu-ibe-ya n’ala: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n’etiti gi.

25 Ma ọ buru na nwoke ahu ahuta nwa-ab͕ọghọ ahu n’ọhia, bú nwayi nwoke kwere ilu, nwoke ahu ewe jigide ya n’ike, soro ya dina; ọ bu kwa nání nwoke nke soro ya dina gānwu:

26 ma ọ dighi ihe i gēmere nwa-ab͕ọghọ ahu; ọ dighi nmehie ọnwu diri nwa-ab͕ọghọ ahu: n’ihi na dika mb͕e nwoke nēbili imegide madu-ibe-ya, we b͕ue ya eb͕u, otú a ka okwu a di:

27 n’ihi na n’ọhia ka ọ hutara ya; nwa-ab͕ọghọ ahu nwoke kwere ilu tiri nkpu, ma ọ dighi onye-nzọputa o nwere.

28 Mb͕e nwoke gāhuta nwa-ab͕ọghọ nke bu nwayi nāmaghi nwoke, nke nwoke nēkweghi ilu, o we jide ya, soro ya dina, ewe huta ha;

29 nwoke ahu nke soro ya dina gēnye kwa nna nwa-ab͕ọghọ ahu ọgu shekel ọla-ọcha abua na iri, ya ka nwa-ab͕ọghọ ahu gābu-kwa-ra nwunye, n’ihi na o wedawo ya n’ala; ọ pughi ichupu ya ubọchi-ya nile.

30 Nwoke agaghi-ekuru nwunye nna-ya, ọ gaghi-ekpughe kwa uwe kpuchiri ọtọ nna-ya.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 23

1 Onye emetara ọnyá site n’ichipia nkpuru-amu-ya, ma-ọbu nke ebipuru amu-ya, agaghi-abà nime nkpọkọta Jehova.

2 Nwa-iko agaghi-abà nime nkpọkọta Jehova; ọbuná ọb͕ọ nke-iri ya agaghi-abà nime nkpọkọta Jehova.

3 Onye Amon ma-ọbu onye Moab agaghi-abà nime kpọkọta Jehova, ọbuna ọb͕ọ nke-iri ha agaghi-abà nime kpọkọta Jehova rue mb͕e ebighi-ebi:

4 n’ihi na ha ejighi achicha na miri bia n’iru unu n’uzọ, mb͕e unu siri n’Ijipt puta; na n’ihi na ha gotara Belam nwa Beoa imegide gi site na Petoa nke Mesọpọtemia, ikọcha gi.

5 Ma Jehova, bú Chineke-gi, ekweghi ige Belam nti; kama Jehova, bú Chineke-gi, b͕anwere nkọcha ahu ka ọ ghọrọ gi ngọzi, n’ihi na Jehova, bú Chineke-gi, huru gi n’anya.

6 Achọla udo-ha na ọdi-nma-ha ubọchi-gi nile rue mb͕e ebighi-ebi.

7 Akpọla onye Edom ihe árú; n’ihi na nwa-nne-gi ka ọ bu: akpọla onye Ijipt ihe-árú; n’ihi na ọbìa ka i buri n’ala-ya.

8 Umu agāmuru ha, ọb͕ọ nke-atọ ha, gābà nime nkpọkọta Jehova.

9 Mb͕e i nāpu dika ọmuma-ulo-ikwū imegide ndi-iro-gi, i gēdebe kwa onwe-gi pua n’ihe ọjọ ọ bula.

10 Mb͕e nwoke ọ bula di n’etiti unu, nke nādighi ọcha, site n’ihe mere ya n’abali, ọ gāpu kwa je n’azu ọmuma-ulo-ikwū, ọ gaghi-abà n’etiti ọmuma-ulo-ikwū:

11 ma ọ gēru, mb͕e ọ nēru anyasi, na ọ gēwere miri sa aru-ya: mb͕e anyanwu nāda, ọ gābà kwa n’etiti ọmuma-ulo-ikwū.

12 I gēnwe kwa otù ebe n’azu ọmuma-ulo-ikwū ebe i ganāpu je n’ọgwe:

13 i gēnwe kwa osekè n’etiti ihe-agha-gi; ọ gēru kwa, mb͕e i nānọdu n’ọgwe, na i gēwere ya gwue ala, i we chigharia kpochie ihe si n’aru-gi puta:

14 n’ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nējeghari n’etiti ọmuma-ulo-ikwū-gi, inaputa gi, na irara ndi-iro-gi nye n’iru gi; ọmuma-ulo-ikwū-gi gādi kwa nsọ: ka O we ghara ihu n’etiti gi ọtọ ihe ọ bula, we laghachi n’iso gi n’azu.

15 Emechibidola orù nye onye-nwe-ya, bú onye naputaworo onwe-ya n’aka onye-nwe-ya b͕akute gi:

16 ọ gēbiyere gi, n’etiti gi, n’ebe ahu nke ọ gārọputa n’otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, n’ebe di ya nma: emela ya ihe-ike.

17 Nwayi edoro nsọ ikwa iko agaghi-adi n’etiti umu-ndinyom Israel, nwoke edoro nsọ ikwa iko agaghi-adi kwa n’etiti umu-ndikom Israel.

18 Ewebatala onyinye enyere nwayi nākwa iko, ma-ọbu ihe eretara na nkita, n’ulo Jehova, bú Chineke-gi, imezù nkwa ọ bula: n’ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ha abua bu kwa.

19 Ebinyela nwa-nne-gi ihe n’uma; bú uma nke ego, ma-ọbu uma nke ihe-oriri, ma-ọbu uma nke ihe ọ bula nke anēbinye n’uma:

20 onye ala ọzọ ka i gēbinye ihe n’uma; ma ebinyela nwa-nne-gi ihe n’uma: ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi na nseti aka-gi nile, n’elu ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya.

21 Mb͕e i gēkwe Jehova, bú Chineke-gi, nkwa, alala azu n’ikwughachi ya: n’ihi na Jehova, bú Chineke-gi, aghaghi iju ase ya n’aka-gi; ọ gābu kwa nmehie nime gi.

22 Ma mb͕e i ghara ikwe nkwa, ọ gaghi-abu nmehie nime gi.

23 Ihe nke nēsi n’eb͕ub͕ere-ọnu-gi puta ka i gēdebe, me kwa; dika i kweworo Jehova, bú Chineke-gi, nkwa, ọ bu onyinye-afọ-ofufo, nke i kwuworo n’ọnu-gi.

24 Mb͕e ọ bula i nābà n’ubi-vine nke ab͕ata-obi-gi, i gēri kwa nkpuru-vine, dika nkpuru-obi-gi si achọ, nke gēju gi afọ; ma etiyela nkpuru ọ bula n’ihe-gi.

25 Mb͕e ọ bula i nābà n’ọka guzoro eguzo nke ab͕ata-obi-gi, i gāghọrọ oko ọka n’aka-gi; ma ewegharila mma-iwe-ihe-ubi n’elu ọka guzoro eguzo nke ab͕ata-obi-gi.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 24

1 Mb͕e nwoke gāluru nwunye, we buru di-ya, ọ gēru kwa, ọ buru na nwayi ahu ahutaghi amara n’iru ya, n’ihi na ọ huwo ihe nēkwesighi ekwesi n’aru ya, na ọ gēdere ya akwukwọ nkewa, we nye ya n’aka, we zipu ya n’ulo-ya.

2 Ma mb͕e o si n’ulo-ya pua, ọ gēje kwa buru nwunye nke nwoke ọzọ.

3 Ma asi na nwoke nke-ikpe-azu ahu akpọ ya asì, de-kwa-ra ya akwukwọ nkewa, we nye ya n’aka, we zipu ya n’ulo-ya; ma-ọbu mb͕e nwoke nke-ikpe-azu ahu gānwu, bú nke lutara ya n’onwe-ya na nwunye;

4 di mbu ya, nke zipuru ya, apughi ikpoghachi ya ọzọ iburu ya nwunye, mb͕e emerusiri ya; n’ihi na ihe-árú ka ọ bu n’iru Jehova: emela ka ala ahu mehie, bú nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ibu ihe-nketa.

5 Mb͕e nwoke gāluru nwunye ọhu, ọ gaghi-apu ba n’usu-ndi-agha, madu agaghi-agabiga rue ebe ọ nọ bayere ihe ọ bula: onye puru n’òfùfè-ala ka ọ gābu n’ulo-ya otù arọ, ọ gēme kwa ka nwunye-ya nke ọ luruworo ṅuria ọṅu.

6 Madu agaghi-ewere nkume-igwe-nri ma-ọbu aka-nkume n’ihe-ibe: n’ihi na ndu madu ka onye ahu nēwere n’ihe-ibe.

7 Mb͕e agāhu onye ọ bula ka o nēzu madu n’ori sitere n’umu-nne-ya, sitere n’umu Israel, o we nēme ya dika orù, ma-ọbu re ya; onye-ori ahu gānwu kwa: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n’etiti gi.

8 Lezie onwe-gi anya n’ihe-otiti ekpenta, ilezi anya nke-ọma, na ime dika ihe nile si di nke ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, gēzí unu: dika m’nyere ha iwu, otú a ka unu gēlezi anya ime.

9 Cheta ihe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, mere Miriam, n’uzọ, mb͕e unu siri n’Ijipt puta.

10 Mb͕e i nēbinye madu-ibe-gi ihe-nbinye ọ bula, abala n’ulo-ya iwere ihe-ibe-ya.

11 N’èzí ka i gēguzo, nwoke ahu onye gi onwe-gi nēbinye ihe gēweputa-kwa-ra gi ihe-ibe-ya n’èzí.

12 Ma ọ buru na onye ewedara n’ala ka ọ bu, ewela ihe-ibe-ya dina ala:

13 i ghaghi inyeghachi ya ihe-ibe ahu mb͕e anyanwu nāda, ka o we dina ala n’uwe-ya, we gọzie gi: o we buru gi ezi omume n’iru Jehova, bú Chineke-gi.

14 Emeb͕ula onye egoro ọlu nke bu onye ewedera n’ala na ob͕eye, ma o sitere n’umu-nne-gi, ma-ọbu na o sitere na ndi-ọbìa-gi ndi nọ n’ala-gi nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula.

15 N’ubọchi-ya ka i gēnye ya ugwọ-ọlu-ya, anyanwu agaghi-adakpu kwa ya; n’ihi na onye ewedara n’ala ka ọ bu, nke ahu ka ya onwe-ya nātukwasi kwa nkpuru-obi-ya: ka o we ghara ikpọku Jehova megide gi, o we buru nmehie nime gi.

16 Agaghi-eme ka ndi bu nna nwua n’ọnọdu umu-ha, agaghi-eme kwa ka umu nwua n’ọnọdu ndi bu nna-ha: agēme ka ha nwua, onye ọ bula nime nmehie nke aka ya.

17 Ewezugala ikpé ọbìa, bú nwa-nb͕ei; ewere-kwa-la uwe nwayi di-ya nwuru n’ihe-ibe:

18 ma i gēcheta na orù ka i buri n’Ijipt, Jehova, bú Chineke-gi, we b͕aputa gi n’ebe ahu: n’ihi nka ka m’nēnye gi iwu ime ihe a.

19 Mb͕e i nēwe ihe-ubi n’ubi-gi, i we chezọ ùkwù ọka n’ubi, ejeghachila iweta ya: ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ka ọ gādiri: ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi n’omume aka-gi nile.

20 Mb͕e i nētisisi nkpuru osisi olive gi, eletala alaka-ya ọzọ n’azu gi: ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ka ọ gādiri.

21 Mb͕e i nāghọrọ nkpuru ubi-vine-gi, atutukọla nkpuru-ya fọduru n’azu gi: ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ka ọ gādiri.

22 I gēcheta kwa na orù ka i buri n’ala Ijipt: n’ihi nka ka m’nēnye gi iwu ime ihe a.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 25

1 Mb͕e ise-okwu di n’etiti ndikom, ha we biaru nso ka ewe kpe ikpe, ndi-ikpé we kpe ha; ha gāgu kwa onye ezi omume n’onye ezi omume, gu kwa onye nēmebi iwu n’onye nēmebi iwu;

2 ọ gēru kwa, ọ buru na onye nēmebi iwu kwesiri ka etie ya ihe, na onye-ikpé gēme ka o dina ala, ka eti kwa ya ihe n’iru ya, dika nke gēzù nmebi-iwu-ya, n’ọnu-ọgugu.

3 Ọgu otiti abua ka o gēti ya, ọ gaghi-eti kari: ka ọ ghara ibu, ma asi na o gēti ya ọtutu otiti ka ndia, na agēlelì kwa nwa-nne-gi n’anya-gi.

4 Ekechila ọnu ehi mb͕e ọ nāzọcha ọka.

5 Mb͕e umu-nne ndikom gēbikọ, otù nime ha ewe nwua, ma ọ nweghi nwa-nwoke, nwunye onye ahu nke nwuru anwu agaghi-aburu nwoke ala ọzọ nwunye n’èzí: nwa-nne di-ya gābakuru ya, luru ya n’onwe-ya na nwunye, we lua ọlu kwesiri nwa-nne di n’ebe ọ nọ.

6 Ọ gēru kwa, na ọkpara ọ gāmu gānọchi n’aha nke nwa-nne-ya nke nwuru anwu, ka aghara ihichapu aha-ya n’Israel.

7 Ma ọ buru na ọ tọghi nwoke ahu iluru nwunye nwa-nne-ya na nwunye, nwunye nwa-nne-ya gārigoru ọnu-uzọ-ama, jekuru ndi-okenye, si, Nwa-nne dim nāju ime ka aha biliere nwa-nne-ya n’Israel, o kweghi ilu ọlu kwesiri nwa-nne di n’ebe m’nọ.

8 Ndi-okenye obodo-ya gākpọ kwa ya, gwa ya okwu: ma asi na o guzo, si, Ọ tọghm iluru ya na nwunye;

9 nwunye nwa-nne-ya gābiaru ya nso n’anya ndi-okenye, tọpu akpukpọ-ukwu-ya n’ukwu-ya, b͕asa ya asọ n’iru, za ya, si, Otú a ka agēme nwoke ahu nke nēwulighi ulo nwa-nne-ya.

10 Agākpọ kwa aha-ya n’Israel, Ulo nke onye atọpuru akpukpọ-ukwu-ya.

11 Mb͕e ndikom gālurita ọ̀gù, otù onye na ibe-ya, ma nwunye nke otù nime ha abiaru nso inaputa di-ya n’aka onye nēti ya ihe, asi na ọ setipu aka-ya, we jide ya na nkpa-amu-ya:

12 i gēbipu kwa aka-ya, anya-gi agaghi-eme ebere.

13 Enwela n’àkpà-gi uzọ nkume-isì-ihe abua, nke-uku na nke-ntà.

14 Enwela n’ulo-gi uzọ ephah abua, nke-uku na nke-ntà.

15 Nkume-isì-ihe zuru okè, nke zi-kwa-ra ezi, ka i gēnwe; ephah zuru okè, nke zi-kwa-ra ezi, ka i gēnwe: ka ubọchi-gi we di anya n’elu ala nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.

16 N’ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ọ bu, bu onye ọ bula nēme ihe ndia, onye ọ bula nēme ajọ omume.

17 Cheta ihe Amalek mere gi n’uzọ, mb͕e unu siri n’Ijipt puta:

18 otù o zutere gi n’uzọ, tib͕ue ndi-ikpe-azu n’etiti gi, ndi nile nādighi ike n’azu gi, mb͕e gi onwe-gi nāda #mbà, mb͕e ike gwu-kwa-ra gi; ma ọ tughi egwu Chineke.

19 O gēru kwa, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēmewori ka i pua n’aka ndi-iro-gi buruburu, zuru ike, n’ala nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi n’ihe-nketa, ka i we nweta ya, na i gēhichapu ncheta Amalek n’okpuru elu-igwe; echezọla.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 26

1 Ọ gēru kwa, mb͕e i gābà n’ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi n’ihe-nketa, mb͕e i gēnweta kwa ya, we biri nime ya;

2 na i gēwere ufọdu nime nkpuru mbu nke nkpuru nile nke ala-ubi, nke i gēsi n’ala-gi nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi webata; i gētiye kwa ya n’abọ, jerue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri n’ebe ahu.

3 I gābiakute kwa onye-nchu-àjà nke gānọ na mb͕e ahu, si ya, Egosiwom Jehova, bú Chineke-gi, ta, na abatawom n’ala ahu nke Jehova ṅuru nna-ayi-hà iyi inye ayi.

4 Onye-nchu-àjà gānara abọ ahu n’aka-gi, dọba ya n’iru ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi.

5 I gāza kwa, si n’iru Jehova, bú Chineke-gi, Onye Siria nke nāla n’iyì ka nnam bu, o we rida n’Ijipt, nọ dika ọbìa n’ebe ahu, ya na ndikom ole-na-ole; o we ghọ mba n’ebe ahu, nke di uku, di kwa ike, ba kwa uba:

6 ndi Ijipt we mejọ ayi, weda ayi n’ala, tukwasi ayi òfùfè siri ike:

7 ayi we tikue Jehova, bú Chineke nke nna-ayi-hà, Jehova we nu olu-ayi, hu kwa nweda-n’ala-ayi, na ndọb͕u ayi nādọb͕u onwe-ayi n’ọlu, na nmeb͕u-ayi:

8 Jehova we were aka di ike, na ogwe-aka esetiri eseti, na egwu uku, na ihe-iriba-ama di iche iche, na ihe-ebube di iche iche, me ka ayi si n’Ijipt puta:

9 O we me ka ayi bata n’ebe a, O we nye ayi ala nka, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.

10 Ma ub͕u a, le, ewetawom nkpuru mbu nke nkpuru ala-ubi nke I nyeworom, Jehova. I gādọba kwa ya n’iru Jehova, bú Chineke-gi, kpọ isi ala n’iru Jehova, bú Chineke-gi:

11 i gāṅuri kwa ọṅu n’ezi ihe nile Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi, nye kwa ulo-gi, gi onwe-gi, na onye Livai, na ọbìa nke nọ n’etiti gi.

12 Mb͕e i gēnyebìwori otù uzọ n’uzọ iri nile nke ihe-ọmume-gi n’arọ nke-atọ, bú arọ nke inye otù uzọ n’uzọ iri, i gēnye kwa ya onye Livai, nye kwa ọbìa, nye kwa nwa-nb͕ei, nye kwa nwayi di-ya nwuru, ka ha we rie nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, afọ ewe ju ha;

13 i gāsi kwa n’iru Jehova, bú Chineke-gi, Ekpochapuwom ihe nsọ ahu n’ulom, ọzọ kwa, enyewom ya ndi Livai, nye kwa ọbìa, nye kwa nwa-nb͕ei, nye kwa nwayi di-ya nwuru, dika ihe nile I nyere n’iwu si di nke I nyerem n’iwu: agabigaghm ihe nile I nyere n’iwu, echezọghkwam:

14 erighm ihe sitere na ya n’iru-újúm, ekpochapughkwam ihe sitere na ya n’adighi-ọcha, enyeghkwam ihe sitere na ya bayere onye nwuru anwu: egewom nti olu Jehova, bú Chinekem, emewom dika ihe nile si di nke I nyeworom n’iwu.

15 Si n’ebe-obibi nsọ Gi, si n’elu-igwe, le anya, gọzie ndi-Gi, bú Israel, na ala-ubi ahu nke I nyeworo ayi, dika I ṅuru nna-ayi-hà iyi, bú ala miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.

16 Ubọchi ta ka Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi iwu ime ukpuru ndia na ikpé ndia: i gēwere kwa obi-gi nile, were kwa nkpuru-obi-gi nile, debe ha, me kwa ha.

17 Jehova ka i meworo ka Ọ si ta na Ọ gāburu gi Chineke, na i gēje kwa ije n’uzọ-Ya nile, debe kwa ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n’iwu, na ikpé-Ya nile, ge kwa nti olu-Ya:

18 Jehova emewo kwa ka i si ta na i gāburu Ya ndi nke aka Ya, dika Ọ gwaworo gi okwu, na i gēdebe kwa ihe nile O nyere n’iwu;

19 na Ọ gēme kwa gi ka i kachasia mba nile O meworo elu, ibu otuto, ibu kwa aha, ibu kwa ihe mara nma; ka i we buru-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ndi nsọ, dika O kwuworo.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 27

1 Moses na ndi-okenye Israel we nye ndi Israel iwu, si, Debe ihe nile enyere n’iwu, nke mu onwem nēnye gi n’iwu ta.

2 Ọ gēru kwa n’ubọchi ahu mb͕e unu gāgabiga Jọdan rue ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, na i gēguzoro onwe-gi nkume uku ọtọ, were ihe-ntechi techie ha:

3 i gēdekwasi kwa ha okwu nile nke iwu a, mb͕e i gabigasiri; ka i we ba n’ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, dika Jehova, bú Chineke nke nna-gi-hà, gwaworo gi okwu.

4 Ọ gēru kwa, mb͕e unu gabigasiri Jọdan, na unu gēguzo nkume ndia ọtọ, nke mu onwem nēnye unu n’iwu, n’ugwu Ibal, i gēwere kwa ihe-ntechi techie ha.

5 I gēwu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ebe-ichu-àjà n’ebe ahu, bú ebe-ichu-àjà nkume: emela ka ihe-ọlu ígwè ga n’elu ha.

6 I gēji nkume zuru okè wue ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi: i gēsure-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, àjà-nsure-ọku n’elu ya:

7 i gāchu kwa àjà-udo, ri kwa ihe n’ebe ahu; i gāǹuri kwa ọṅu n’iru Jehova, bú Chineke-gi.

8 I gēdekwasi kwa na nkume ndia okwu nile nke iwu a, agātu akika ha nke-ọma.

9 Moses na ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, we gwa Israel nile okwu, si, Nọdu du, ge kwa nti, Israel; ubọchi ta ka i ghọworo Jehova, bú Chinek-gi, otù ndi.

10 I gēge kwa nti olu Jehova, bú Chineke-gi, me ihe nile O nyere n’iwu, na ukpuru-Ya nile, nke mu onwem nēnye gi n’iwu ta.

11 Moses we nye ndi Israel iwu n’ubọchi ahu, si,

12 Ndia gēguzo n’elu ugwu Geraizim igọzi ndi Israel, mb͕e unu gabigasiri Jọdan; Simeon, na Livai, na Juda, na Isaka, na Josef, na Benjamin:

13 ndia gēguzo kwa n’ugwu Ibal bayere nkọcha; Reuben, na Gad, na Asha, na Zebulun, na Dan, na Naftali.

14 Ndi Livai gēwere olu di elu za, si ndikom nile nke Israel,

15 Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēme arusi apiri api ma-ọbu arusi awuru awu, bu ihe-árú nke Jehova, ọlu aka nke onye nātu akika, we tiye ya n’ebe nzuzo. Ndi Israel nile gāza kwa, si, Amen.

16 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēlelì nna-ya ma-ọbu nne-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.

17 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēwezuga ókè-ala ab͕ata-obi-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.

18 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēme onye-ìsì ka ọ jehie n’uzọ. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.

19 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēwezuga ikpé nke ọbìa, na nke nwa-nb͕ei, na nke nwayi di-ya nwuru. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.

20 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na nwunye nna-ya nēdina; n’ihi na o kpughewo uwe kpuchiri ọtọ nna-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.

21 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na anumanu ọ bula nēdina. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.

22 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na nwa-nne-ya nwayi nēdina, bú nwa-nwayi nke nna-ya, ma-ọbu nwa-nwayi nke nne-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.

23 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na nne-nwunye-ya nēdina. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.

24 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nētib͕u madu-ibe-ya na nzuzo. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.

25 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nānara ihe-iri-ngo itib͕u madu, bú iwusi ọbara nke onye nēmeghi ihe ọjọ. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.

26 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēmeghi ka okwu nile nke iwu a guzosie ike, ime ha. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.