Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 34

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Nye umu Israel iwu, si ha, Mb͕e unu onwe-unu ganābata n’ala Kenean, (nka bu ala nke gēru unu aka n’ihe-nketa, bú ala Kenean dika ókè-ala-ya-nile si di,)

3 akuku Ndida unu nwe-kwa-ra gēsite n’ọzara Zin n’akuku Edom, ókè-ala Ndida unu nwere gēsite kwa na nsọtu ahu nke Oké Osimiri Nnu nke chere iru n’Iru-anyanwu:

4 ókè-ala unu nwere gēsi kwa na Ndida b͕a buruburu rue nrigo Akrabim, ọ gāgabiga kwa rue Zin: ọpupu-ya nile gēsi kwa na Ndida Kedesh-banea; ọ gāpuru kwa Heza-ada, we gabiga rue Azmon:

5 ókè-ala ahu gēsi kwa n’Azmon b͕a buruburu rue miri-iyi Ijipt, ọpupu-ya nile gādiru kwa oké osimiri.

6 Ókè-ala ọdida-anyanwu kwa, unu gēnwe ọbuná oké osimiri uku ahu na ókè-ya: nka gāburu unu ókè-ala Ọdida-anyanwu

7 Nka gābu-kwa-ra unu ókè-ala Ugwu: unu gēsi n’oké osimiri uku ahu kpaputara onwe-unu ugwu Hoa:

8 unu gēsi n’ugwu Hoa kpaputarue nbata Hemat; ọpupu nile nke ókè-ala ahu gādiru kwa Zedad:

9 ókè-ala ahu gāputaru Zifron, ọpupu-ya nile gādiru kwa Heza-inan: nka gāburu unu ókè-ala Ugwu.

10 Unu gākpaputa-kwa-ra onwe-unu, ka ọ buru ókè-ala Iru-anyanwu, site na Heza-inan rue Shefam:

11 ókè-ala ahu gārida kwa site na Shefam rue Ribla, n’akuku Iru anyanwu Ain; ókè-ala ahu gārida kwa, we metu akuku oké osimiri Kineret nke chere iru n’Iru-anyanwu:

12 ókè-ala ahu gāridaru kwa Jọdan, ọpupu-ya nile gādiru kwa Oké Osimiri Nnu: nka gāburu unu ala, dika ókè-ala-ya nile si di buruburu.

13 Moses we nye umu Israel iwu, si, Nka bu ala ahu nke unu gēketa n’ife-nzà, nke Jehova nyere iwu bayere ya inye ebo iteghete ahu na nkera ebo ahu:

14 n’ihi na ebo umu ndi Reuben dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, na ebo umu ndi Gad dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, anarawo, nkera ebo Manase anarawo kwa, ihe-nketa-ha;

15 ebo abua ahu na nkera ebo ahu anarawo ihe-nketa-ha n’ofè Jọdan nka na nso Jeriko n’akuku Iru-anyanwu, n’uzọ ọwuwa-anyanwu.

16 Jehova we gwa Moses okwu, si,

17 Ndia bu aha ndikom ahu ndi gēme ka unu keta ala ahu: Eleeza, bú onye nchu-àjà, na Joshua nwa Nun.

18 Ọ bu kwa otù onye-isi otù onye-isi site n’ebo ọ bula ka unu gēkuru, ime ka eketa ala ahu.

19 Ndia bu aha ndikom ahu: nke ebo Juda, Keleb nwa Jefune.

20 Nke ebo umu Simeon, Shemuel nwa Amihud.

21 Nke ebo Benjamin, Elidad nwa Kislon.

22 Nke ebo umu Dan otù onye-isi kwa, bú Biku nwa Jọgli.

23 Nke umu Josef: nke ebo umu Manase otù onye-isi, bú Haniel nwa Ifod:

24 nke ebo umu Efraim otù onye-isi kwa, bú Kemuel nwa Shiftan.

25 Nke ebo umu Zebulun otù onye-isi kwa, bú Elizafan nwa Panak.

26 Nke ebo umu Isaka otù onye-isi kwa, bú Paltiel nwa Azan.

27 Nke ebo umu Asha otù onye-isi kwa, bú Ahihud nwa Shelomi.

28 Nke ebo umu Naftali otù onye-isi kwa, bú Padahel nwa Amihud.

29 Ndia bu ndi Jehova nyere iwu ime ka umu Israel Keta ala n’ala Kenean.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 35

1 Jehova we gwa Moses okwu n’ala ihe nādighi nke Moab n’akuku Jọdan na nso Jeriko, si,

2 Nye umu Israel iwu, ka ha si n’ihe-nketa nke ihe-onwunwe-ha nye ndi Livai obodo ibi nime ha; ebe-ita-nri nke obodo ahu gēnwe buruburu ha ka unu gēnye kwa ndi Livai.

3 Obodo ahu gābu-kwa-ra ha ebe ibi nime ha; ebe-ita-nri-ha gādi-kwa-ra anu-ulo-ha, di-kwa-ra àkù-ha, di-kwa-ra anu nile ha.

4 Ebe-ita-nri nke obodo nile, nke unu gēnye ndi Livai, gādi nnù cubit abua na ọgu iri site na mb͕idi obodo we gaba n’azu-ya buruburu.

5 Unu gātu kwa n’azu obodo akuku Iru anyanwu, nnù cubit ise, na akuku Ndida, nnù cubit ise, na akuku Ọdida-anyanwu, nnù cubit ise, na akuku Ugwu cubit ise, obodo gābi kwa n’etiti. Nka gāburu ha ebe-ita-nri nke obodo-ha.

6 Obodo nile nke unu gēnye ndi Livai, ha gābu obodo isi nke nb͕abà, nke unu gēnye ka ob͕u-madu we b͕alaga n’ebe ahu: unu genye kwa ọgu obodo abua na abua tiyere ha.

7 Obodo nile nke unu gēnye ndi Livai bu ọgu obodo abua na asatọ ha na ebe-ita-nri-ha.

8 Ma obodo nile ahu nke unu gēnye site n’ihe-onwunwe nke umu Israel, n’aka ndi bara uba ka unu gānara ọtutu obodo; ma n’aka ndi di ole-na-ole ka unu gānara obodo ole-na-ole: ọ bu dika ala-nketa-ya si di, nke ha nēketa, ka onye ọ bula gēnye ndi Livai site n’obodo-ya nile.

9 Jehova we gwa Moses okwu, si,

10 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu onwe-unu ganāgabiga Jọdan ba n’ala Kenean,

11 unu gārọputa-kwa-ra onwe-unu obodo ufọdu, obodo nb͕aba ka ha gāburu unu; ka ob͕u-madu onye nētib͕u madu n’ọghọm we b͕alaga n’ebe ahu.

12 Obodo nile ahu gābu-kwa-ra unu ebe-nb͕abà agēsi n’aka onye-ọ́bọ̀ b͕alaga; ka ob͕u-madu we ghara inwu, rue mb͕e ọ gēguzo n’iru nzukọm ka ekpe ya ikpe.

13 Obodo ndia nke unu gēnye, obodo isi nke nb͕abá ka ha gāburu unu.

14 Obodo atọ ka unu gēnye n’ofè Jọdan nka, obodo atọ ka unu gēnye kwa n’ala Kenean; obodo nb͕abá ka ha gābu.

15 Obodo isi ndia gāburu umu Israel, buru kwa ọbìa, buru kwa onye bi n’etiti ha, ebe-nb͕abà: ka onye ọ bula nke nētib͕u madu n’ọghọm we b͕alaga n’ebe ahu.

16 Ma ọ buru na ọ were ihe ígwè tie ya, ọ we nwua, ob͕u-madu ka ọ bu: aghaghi ime ka ob͕u-madu ahu nwua.

17 Ọ buru kwa na o were nkume di ya n’aka, bú nke gēme ka madu nwua, tie ya, o we nwua, ob͕u-madu ka ọ bu: aghaghi ime ka ob͕u-madu ahu nwua.

18 Ma ọ buru na o were ihe osisi di ya n’aka, bú nke gēme ka madu nwua, tie ya, o we nwua, ob͕u-madu ka ọ bu: aghaghi ime ka ob͕u-madu ahu nwua.

19 Onye-ọ́bọ̀ ọbara, ya onwe-ya gēme ka ob͕u-madu ahu nwua: mb͕e o zutere ya, ya onwe-ya gēme ka ọ nwua.

20 Ọ buru kwa na ọ kwatue ya n’ikpọ-asì, ma-ọbu tua ya ihe, mb͕e o nēche anwu, o we nwua;

21 ma-ọbu asi na o were aka-ya tie ya n’iro, o we nwua; aghaghi ime ka onye nētib͕u ya nwua; ob͕u-madu ka ọ bu: onye-ọ́bọ̀, ọbara gēme ka ob͕u-madu ahu nwua, mb͕e o zutere ya.

22 Ma ọ buru na ọ bu na mberede ka ọ kwaturu ya, mb͕e ọ nādighi n’iro, ma-ọbu tua ya ihe ọ bula, mb͕e ọ nēcheghi anwu,

23 ma-ọbu asi na o were nkume ọ bula, bú nke gēme ka madu nwua, me ka ọ dakwasi ya, mb͕e ọ nāhughi ya, o we nwua, ma onye ahu abughi onye-iro-ya, ọ bughi kwa onye nāchọ ime ya ihe ọjọ:

24 nzukọm gēkpe kwa n’etiti oti-ihe ahu na onye-ọ́bọ̀ ọbara dika ikpé ndia si di:

25 nzukọm gānaputa kwa ob͕u-madu ahu n’aka onye-ọ́bọ̀ ọbara, nzukọm gēme kwa ka ọ laghachi n’obodo nb͕abà ya, ebe ọ b͕alagara: o gēbi kwa nime ya rue mb͕e ọnwu onye-isi-nchu-àjà, nke ewere manu nsọ ahu te.

26 Ma ọ buru na ob͕u-madu ahu esi n’ókè-ala obodo nb͕abà ya pua ma-ọli, bú ebe ọ b͕alagara;

27 onye-ọ́bọ̀ ọbara ewe huta ya n’azu ókè-ala abodo nb͕abà ya, onye-ọ́bọ̀ ọbara ahu we b͕ue ob͕u-madu ahu, ọ dighi ikpe ọbara mara ya:

28 n’ihi na nime obodo nb͕abà ya ka o gēbi rue mb͕e ọnwu onye-isi-nchu-àjà: ma mb͕e ọnwu onye-isi-nchu-àjà gasiri ob͕u-madu ahu gālaghachi n’ala ihe-onwunwe-ya.

29 Ihe ndia gābu-kwa-ra unu ukpuru ikpé rue ọb͕ọ nile unu n’ebe-obibi-unu nile.

30 Onye ọ bula nke nētib͕u madu, n’ọnu ndi-àmà ka agēb͕u ob͕u-madu ahu: ma nání otù onye-àmà agaghi-ab͕agide madu àmà ka ọ nwua.

31 Unu anara-kwa-la ihe-nb͕aputa n’ọnọdu ndu ob͕u-madu, nke ikpe inwu ọnwu maworo: ma aghaghi ime ka ọ nwua.

32 Unu anara-kwa-la ihe nb͕aputa n’ọnọdu onye b͕alagaworo n’obodo nb͕abà ya, ka ọ we lata ibi n’ala-ya, rue mb͕e ọnwu onye-nchu-àjà.

33 Unu emeru-kwa-la ala ahu nke unu onwe-unu bi nime ya: n’ihi na ọbara, nke ahu nēmeru ala: ma ala, agaghi-ekpuchiri ya nmehie-ya bayere ọbara awusiri nime ya, ma-ọbughi nání n’ọbara nke onye wusiri ya.

34 Eme-kwa-la ka ala ahu, nke unu onwe-unu nēbi nime ya, rua árú, nke Mu onwem nēbi n’etiti ya: n’ihi na Mu onwem, bú Jehova, nēbi n’etiti umu Israel.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 36

1 Ndi-isi nke ndi bu nna nke ab͕uru umu Gilead, nwa Makia, nwa Manase, n’etiti ab͕uru umu Josef, we biarue nso, kwue okwu n’iru Moses, na n’iru ndi-isi, bú ndi-isi nke ndi bu nna nke umu Israel:

2 ha we si, Jehova nyere onye-nwem iwu inye umu Israel ala ahu n’ihe-nketa n’ife-nzà: enye-kwa-ra onye-nwem iwu n’ọnu Jehova iwere ihe-nketa Zelọfehad, bú nwa-nne-ayi, nye umu-ya ndinyom.

3 Ma asi na ha gāghọrọ nwoke ọ bula nke sitere n’umu ebo ọzọ nke umu Israel nwunye, agāgupu kwa ihe-nketa-ha n’ihe-nketa nke nna-ayi-hà, tukwasi ya n’ihe-nketa ebo ahu nke gēnwe ha: ewe gupu ya n’ihe ife-nzà nke ihe-nketa-ayi.

4 Ọ buru kwa na ọ bu jubile nke umu Israel, agātukwasi kwa ihe-nketa-ha n’ihe-nketa nke ebo ahu nke gēnwe ha: ewe gupu ihe-nketa-ha n’ihe-nketa ebo nna-ayi-hà.

5 Moses we nye umu Israel iwu n’okwu-ọnu Jehova, si, Ihe ziri ezi ka ebo umu Josef nēkwu.

6 Nka bu ihe Jehova nyeworo n’iwu bayere umu-ndinyom Zelọfehad, si, Nwoke di nma n’anya-ha ka ha gāburu nwunye; nání ọ bu ab͕uru nke ebo nke ndi bu nna-ha ka ha gāburu nwunye.

7 Ọ dighi kwa ihe-nketa umu Israel nwere gēsi n’ebo fe n’ebo ọzọ buruburu: n’ihi na umu Israel gārapara, nwoke ọ bula n’ihe-nketa ebo nna-ya-hà.

8 Nwa-nwayi nwoke ọ bula, nke nēnweta ihe-nketa n’ebo nile nke umu Israel, gāburu otù nwoke sitere n’ab͕uru nke ebo nna-ya nwunye, ka umu Israel we nweta, nwoke ọ bula ihe-nketa nna-ya-hà.

9 Ọ dighi kwa ihe-nketa gēsi n’ebo fe n’ebo ọzọ buruburu; n’ihi na ebo nile nke umu Israel gārapara, nwoke ọ bula n’ihe-nketa nke aka ya.

10 Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka umu-ndinyom Zelọfehad mere:

11 Mahla, na Tiaza, na Họgla, na Milka, na Noa, bú umu-ndinyom Zelọfehad, we buru nwunye umu umu-nne nna-ha.

12 Ọ bu ndikom nke sitere n’ab͕uru umu Manase nwa Josef ka ha buru nwunye, ihe-nketa-ha we digide n’ebo nke ab͕uru nna-ha.

13 Ndia bu ihe enyere n’iwu, na ikpé, nke Jehova nyere umu Israel n’iwu n’aka Moses n’ala ihe nādighi nke Moab n’akuku Jọdan na nso Jeriko.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 1

1 Ndia bu okwu ahu nke Moses gwara Israel nile n’ofè Jọdan n’ọzara, n’Araba ahu na ncherita-iru Suf, n’etiti Peran, na Tofel, na Leban, na Hazerot, na Di-zahab.

2 Ọ bu ubọchi iri na otù site na Horeb rue Kedesh-banea ma i si n’uzọ ugwu Sia.

3 O rue, n’arọ nke-ọgu-abua, n’onwa nke-iri-na-otù, n’ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na Moses gwara umu Israel okwu, dika ihe nile Jehova nyere ya n’iwu inye ha si di;

4 mb͕e o tib͕usiri Saihon, bú eze ndi-Amorait, nke bi na Heshbon, na Og, bú eze Beshan, nke bi n’Ashtarot, n’Edrei:

5 n’ofè Jọdan, n’ala Moab, ka Moses jisiri ike ikpọputa isi iwu a, si,

6 Jehova, bú Chineke-ayi, gwara ayi okwu na Horeb, si, O zuworo unu ibi n’ugwu a:

7 chenu iru, bulie ije, ba n’ugwu ndi-Amorait, ru kwa ab͕ata-ya nile, n’Araba, na n’ugwu, na n’ebe di ala ala, na nime Negeb, na n’ọnu-miri nke oké osimiri, bú ala nke ndi Kenean, na Lebanon, rue Osimiri uku ahu, bú osimiri Yufretis.

8 Le, edowom ala ahu n’iru unu: banu, nweta ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi, bú Abraham na Aisak na Jekob, inye ha, inye kwa nkpuru-ha gānọchi ha.

9 M’we gwa unu okwu na mb͕e ahu, si, Apughm ibū unu náním:

10 Jehova, bú Chineke-unu, emewo ka unu ba uba, ma, le, unu di ka kpakpando elu-igwe n’uba, ta.

11 Jehova, bú Chineke nna-unu-hà, tukwasi unu madu kari ka unu ra nnù uzọ abua na ọgu uzọ iri, gọzi kwa unu, dika Ọ gwara unu!

12 M’gēsi aṅa, náním, bū ike-ọgwugwu-unu, na ibu-unu, na ise-okwu-unu?

13 Doro onwe-unu ndikom mara ihe, ndi nwe-kwa-ra nghọta, ndi ama-kwa-ra aha-ha, dika ebo nile unu si di, m’gēdo kwa ha ndi-isi-unu.

14 Unu we zam, si, Ihe nke i kwuworo di nma ime.

15 M’we chiri ndi-isi ebo nile unu, ndikom mara ihe, ndi ama-kwa-ra aha-ha, m’we do ha ndi-isi-unu, ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi madu iri madu iri, na ndi-odozi-okwu, dika ebo nile unu si di.

16 M’we nye ndi-ikpe-unu iwu na mb͕e ahu, si, Nānunu ikpé n’etiti umu-nne-unu, nēkpe-kwa-nu ikpe ezi omume n’etiti nwoke na nwa-nne-ya na ọbìa-ya.

17 Unu amatala iru madu n’ikpé; unu gānu ikpé onye ntà na ikpé onye uku n’otù uzọ ahu; unu atula iru madu ujọ; n’ihi na ikpé ahu, ọ bu Chineke nwe ya: ma okwu nke sikari unu ike, unu gēweta ya nsom, m’gānu kwa ya.

18 M’we nye unu n’iwu na mb͕e ahu ihe nile unu gēme.

19 Ayi we si na Horeb bulie ije, we je ije nime ọzara uku ahu di egwu nke unu huru, n’uzọ ugwu ndi-Amorait, dika Jehova, bú Chineke-ayi, nyere ayi iwu; ayi we biarue Kedesh-banea.

20 M’we si unu, Unu abiaruwo ugwu ndi-Amorait, nke Jehova, bú Chineke-ayi, nēnye ayi.

21 Le, Jehova, bú Chineke-gi, edowo ala ahu n’iru gi: rigo, nweta, dika Jehova, bú Chineke nna-gi-hà, gwaworo gi okwu; atula egwu, atu-kwa-la ujọ.

22 Unu we biaruem nso, unu nile, si, Ka ayi zìe ndikom n’iru ayi, ka ha we leputara ayi ala ahu, weghachi-kwa-ra ayi okwu bayere uzọ nke ayi gēsi rigo, na obodo nke ayi gābà nime ha.

23 Okwu ahu we di nma n’anyam: m’we si n’etiti unu chiri ndikom iri na abua, otù nwoke diri otù ebo:

24 ha we che iru, rigo n’ugwu ahu, biarue ndagwurugwu Eshkol, we ledo ya.

25 Ha we were ufọdu nime nkpuru ala ahu n’aka-ha, wedatara ayi ya, weghachiri ayi okwu, si, Ọ di nma, bú ala nke Jehova, bú Chineke-ayi, nēnye ayi.

26 Ma unu achọghi irigo, kama unu nupuru isi n’okwu-ọnu Jehova, bú Chineke-unu:

27 unu we tamu ntamu n’ulo-ikwū-unu, si, N’asì nke Jehova kpọrọ ayi ka O mere ka ayi si n’ala Ijipt puta, inye ayi n’aka ndi-Amorait, ikpochapu ayi.

28 Òle ebe ayi onwe-ayi nārigo? umu-nne-ayi emewo ka obi-ayi ghara idi ike, si, Ọ bu ndi di uku di kwa ogologo kari ayi, na obodo uku ewusiri ike rue elu-igwe; ọzọ kwa, umu Anakim ka ayi huru n’ebe ahu.

29 M’we si unu, Unu amala jijiji, unu atu-kwa-la egwu ha.

30 Jehova, bú Chineke-unu, Onye nēje n’iru unu, Ya onwe-ya gēburu unu agha, dika ihe nile si di nke O mere bayere unu n’Ijipt n’anya-unu;

31 na n’ọzara, ebe i huworo na Jehova, bú Chineke-gi, kuru gi, dika nwoke si eku nwa-ya nwoke, n’uzọ ahu nile nke unu jere, rue mb͕e unu biaruru ebe a.

32 Ma n’okwu nka unu ekweghi na Jehova, bú Chineke-unu,

33 Onye nēje n’iru unu n’uzọ ahu, ileputara unu ebe ima ulo-ikwū-unu, n’ọku n’abali, ime ka unu hu uzọ nke unu gēje nime ya, na n’igwé-oji ahu n’ehihie.

34 Jehova we nu olu okwu nile unu, O we we iwe, ṅua iyi, si,

35 Ọ dighi otù nwoke nime ndikom ndia nke ọb͕ọ ọjọ nka gāhu ezi ala ahu ma-ọli, bú ala nke M’ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha,

36 ma ọ bu nání Keleb nwa Jefune, ya onwe-ya gāhu ya; ọ bu ya ka M’gēnye ala ahu nke ọ zọkwasiri ukwu, M’gēnye kwa umu-ya: n’ihi na o sozuwo Jehova n’azu

37 Ọ bu kwa mu ka Jehova wesara iwe n’ihi unu, si, Gi onwe-gi kwa, i gaghi-abà n’ebe ahu:

38 Joshua nwa Nun, nke nēguzo n’iru gi, ya onwe-ya gābà n’ebe ahu: gi me ya ka ọ di ike; n’ihi na ya onwe-ya gēme ka Israel keta ya.

39 Ma umu-ntakiri-unu, ndi unu siri na ha gāghọ ihe alutara n’agha, na umu-unu ndikom, ndi nāmaghi ezi ihe na ihe ọjọ ta, ndi ahu gābà n’ebe ahu, ha ka M’gēnye kwa ya, ha onwe-ha gēnweta kwa ya.

40 Ma unu onwe-unu, chenu iru, bulie ije, ba n’ọzara n’uzọ Oké Osimiri Uhie.

41 Unu we za, sim, Ayi emehiewo megide Jehova, ayi onwe-ayi gārigo, bū agha, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-ayi, nyere ayi n’iwu. Unu we ke, nwoke ọ bula ihe-agha-ya, we kpọ ya ihe nfe irigo n’ugwu ahu.

42 Jehova we sim, Si ha, Unu arigola, unu ebu-kwa-la agha; n’ihi na Mu anọghi n’etiti unu; ka aghara itib͕u unu n’iru ndi-iro-unu.

43 M’we gwa unu okwu, ma unu anughi; ma unu nupuru isi n’okwu-ọnu Jehova, we were nganga rigorue ugwu ahu.

44 Ndi-Amorait, ndi bi n’ugwu ahu, we puta izute unu, ha we chua unu, dika anwu si eme, we zọpia unu nime Sia, rue Họma.

45 Unu we laghachi, kwa ákwá n’iru Jehova; ma Jehova egeghi nti n’olu-unu, Ọ ṅaghi kwa unu nti.

46 Unu we biri na Kedesh ọtutu ubọchi, dika ubọchi nile si di nke unu biri n’ebe ahu.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 2

1 Ayi we che iru, bulie ije ba n’ọzara n’uzọ Oké Osimiri Uhie, dika Jehova gwaram okwu: ayi we je ugwu Sia buruburu ọtutu ubọchi.

2 Jehova we gwam okwu, si,

3 O zuworo unu, bú ije ugwu a buruburu: chenu iru n’Ugwu n’onwe-unu.

4 Gi nye kwa ndim iwu, si, Unu onwe-unu nāgabiga n’ókè-ala umu-nne-unu, bú umu Isọ, ndi bi na Sia; ha gātu kwa egwu unu: ma unu gēlezi onwe-unu anya nke-uku:

5 unu alusola ha ọ̀gù; n’ihi na M’gaghi-enye unu ala sitere n’ala-ha, ọbuná rue ebe nzọkwasi ọbu-ukwu-unu: n’ihi na ọ bu Isọ ka M’nyeworo ugwu Sia, ka ọ buru ihe-nnweta.

6 Unu gēwere ego zuru ihe-oriri n’aka-ha, ka unu we rie; ọzọ kwa, unu gēwere ego zuru miri n’aka-ha, ka unu we ṅua.

7 N’ihi na Jehova, bú Chineke-gi, agọziwo gi n’omume aka-gi nile: Ọ mawo ije-ije-gi n’ọzara uku a: ọgu arọ abua ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi; ọ dighi ihe kọrọ gi.

8 Ayi we si n’ala umu-nne-ayi, bú umu Isọ, ndi bi na Sia, gabiga, site n’uzọ Araba, site n’Ilat, site kwa n’Ezion-geba.

Ayi we che iru, gabiga n’uzọ ọzara Moab.

9 Jehova we sim, Akpab͕ula Moab, aluso-kwa-la ha ọ̀gù n’agha: n’ihi na M’gaghi-enye gi ala sitere n’ala-ya ibu ihe-nnweta; n’ihi na umu Lot ka M’nyeworo ya ka ọ buru ihe-nnweta.

10 (Imim biri nime ya na mb͕e gara aga, ndi di uku, di kwa ọtutu, di kwa ogologo, dika ndi Anak;

11 Refaim ka anāgu kwa ndia, dika ndi Anak; ma ndi Moab nākpọ ha Imim.

12 Ọ bu kwa na Sia ka ndi Hoa bi na mb͕e gara aga, ma umu Isọ napuru ha ala-ha; ha we kpochapu ha n’iru ha, bichie n’ọnọdu ha; dika umu Israel mere ala nke ihe-nnweta-ya, nke Jehova nyere ha.)

13 Ub͕u a, bilienu, gabiga miri-iyi Zered n’onwe-unu. Ayi we gabiga miri-iyi Zered.

14 Ubọchi nile nke ayi siri na Kedesh-banea je ije, rue mb͕e ayi gabigara miri-iyi Zered, di orú arọ na iri na asatọ; rue mb͕e ọb͕ọ nile nke ndikom agha si n’etiti ọmuma-ulo-ikwū gwusia, dika Jehova ṅuru ha iyi.

15 Ọzọ kwa, aka Jehova digidere ha, ikpochapu ha n’etiti ọmuma-ulo-ikwū, rue mb͕e emere ka ha gwusia.

16 Ọ we rue, mb͕e ndikom agha ahu nile nwupusiri n’etiti ndi Israel,

17 na Jehova gwaram okwu, si,

18 Gi onwe-gi nāgabiga ya, bu ókè-ala Moab, ta:

19 ma mb͕e i nābiaru nso ncherita-iru umu Amon, akpab͕ula ha, aluso-kwa-la ha ọ̀gù: n’ihi na M’gaghi-enye gi ala sitere n’ala umu Amon ka ọ buru ihe-nnweta: n’ihi na umu Lot ka M’nyeworo ya ibu ihe-nnweta.

20 (Ala Refaim ka agu-kwa-ra nke ahu: Refaim biri nime ya na mb͕e gara aga; ma ndi Amon nākpọ ha Zamzumim;

21 ndi di uku, di kwa ọtutu, di kwa ogologo, dika ndi Anak; ma Jehova kpochapuru ha n’iru ha; ha we napu ha ala-ha, bichie n’ọnọdu ha:

22 dika ihe O mere nye umu Isọ, ndi bi na Sia, mb͕e o kpochapuru ndi Hoa n’iru ha; ha we napu ha ala-ha, bichie n’ọnọdu ha rue ta:

23 ma Avim ndi bi n’obodo ntà rue Geza, Kaftorim, ndi si na Kaftoa puta, kpochapuru ha, bichie n’ọnọdu ha.)

24 Bilienu, bulie ije, gabiga ndagwurugwu Anon: le, enyewom Saihon onye-Amorait, bú eze Heshbon, na ala-ya, n’aka-gi: malite inweta ya, luso kwa ya ọ̀gù n’agha:

25 Ta ka M’gāmalite itiyekwasi ujọ-gi na egwu-gi n’iru ndi nile n’okpuru elu-igwe nile, ndi gānu akukọ-gi, ma kwa jijiji, ọ gēb͕u kwa ha nb͕u n’ihi unu.

26 M’we si n’ọzara Kedimot zigara Saihon, bú eze Heshbon, ndi-ozi izì okwu udo, si,

27 Ka m’gabiga n’ala-gi: n’uzọ n’uzọ ka m’ganēje, m’gaghi-ewezuga onwem n’aka-nri, ma-ọbu n’aka-ekpe.

28 N’ego ka i gērenyem ihe-oriri, ka m’we rie; n’ego ka i gēnyekwam miri, ka m’we ṅua: nání kwe ka m’gabiga n’ukwum;

29 dika umu Isọ ndi bi na Sia, na ndi Moab ndi bi na ya merem; rue mb͕e m’gāgabiga Jọdan, ba n’ala ahu nke Jehova, bú Chineke-ayi, nēnye ayi.

30 Ma Saihon, bú eze Heshbon, achọghi ka ayi gabiga n’ala-ya: n’ihi na Jehova, bú Chineke-gi, mere mọ-ya ka ọ di ike, b͕a kwa obi-ya ume, ka O we nye ya n’aka-gi, otú ọ di ta.

31 Jehova we sim, Le, amalitewom irara Saihon na ala-ya nye n’iru gi: malite inweta, ka i we nweta ala-ya.

32 Saihon we puta izute ayi, ya onwe-ya na ndi-ya nile, ibu agha, rue Jehaz.

33 Jehova, bú Chineke-ayi, we rara ya nye n’iru ayi, ayi we tib͕ue ya, na umu-ya ndikom, na ndi-ya nile.

34 Ayi we were obodo-ya nile na mb͕e ahu, wezuga obodo ndikom ọ bula, ya na ndinyom na umu-ntakiri, ka ebibie ha; ọ dighi onye fọduru ayi rapuru:

35 nání anu-ulo ka ayi lutara n’agha n’onwe-ayi, ha na ihe-nkwata obodo nile nke ayi were.

36 Site n’Aroea, nke di n’usọ ndagwurugwu Anon, na obodo ahu nke di na ndagwurugwu ahu, we rue Gilead, ọ dighi obodo nke kariri ayi elu: ihe nile ka Jehova, bú Chineke-ayi, rara nye n’iru ayi:

37 nání, i biarughi nso ala umu Amon; akuku nile nke miri-iyi Jabok, na obodo nile nke ugwu, na ebe ọ bula Jehova, bú Chineke-ayi, nyere ayi iwu bayere ya.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 3

1 Ayi we che iru, rigo n’uzọ Beshan: Og, bú eze Beshan, we puta izute ayi, ya onwe-ya na ndi-ya nile, ibu agha, rue Edrei.

2 Jehova we sim, Atula egwu ya: n’ihi na n’aka-gi ka M’nyeworo ya, na ndi-ya nile, na ala-ya; i gēme kwa ya dika i mere Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon.

3 Jehova, bú Chineke-ayi, we nye kwa n’aka-ayi Og, bú eze Beshan, na ndi-ya nile: ayi we tib͕ue ya rue mb͕e ọ nādighi otù onye fọduru arapuru ya.

4 Ayi we were obodo-ya nile na mb͕e ahu; ọ dighi obodo ayi nānaraghi n’aka-ha; ọgu obodo atọ, akuku Agob nile, bú ala-eze Og nime Beshan.

5 Ndia nile bu obodo eji mb͕idi di elu, na ọnu-uzọ-ama, na nkpọrọ, wusi ike; nāgughi obodo nēnweghi mb͕idi, ha bara uba nke-uku.

6 Ayi we wezuga ha ka ebibie ha, dika ayi mere Saihon, bú eze Heshbon, nēwezuga obodo, ndikom ọ bula, ya na ndinyom, na umu-ntakiri, ka ebibie ya.

7 Ma anu-ulo nile, na ihe-nkwata nke obodo ahu nile, ayi lutara ha n’agha n’onwe-ayi.

8 Na mb͕e ahu ka ayi nara ala ahu n’aka eze abua nke ndi-Amorait ndi bi n’ofè Jọdan, site na ndagwurugwu Anon rue ugwu Heamon:

9 (ndi Saidon nākpọ Heamon ahu Sirion, ma ndi-Amorait nākpọ ya Senia;)

10 bú obodo nile nke ala ahu di lari, na Gilead nile, na Beshan nile, rue Saleka na Edrei, bú obodo ala-eze Og nime Beshan.

11 (N’ihi na nání Og, bú eze Beshan, ka arapuru site na ndi fọduru nke Refaim; le, ihe-ndina-ya bu ihe-ndina ígwè; ihe-ndina ahu, ọ̀ dighi na Raba nke umu Amon? cubit iteghete ka ogologo-ya di, cubit anọ ka obosara-ya di kwa, dika cubit nke nwoke si di.)

12 Ala nka ka ayi nweta-kwa-ra mb͕e ahu: site n’Aroea, nke di n’akuku ndagwurugwu Anon, na nkera ugwu Gilead, na obodo nile ya, ka m’nyere ndi Reuben nye kwa ndi Gad:

13 nke fọduru nime Gilead, na Beshan nile, bú ala-eze Og, ka m’nyere nkera ebo Manase; akuku Agob nile (Beshan ahu nile ka anākpọ ala Refaim.

14 Jaia nwa Manase were akuku Agob nile, rue ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat; ọ we kpọ ha Beshan-havot-jaia, n’aha-ya, rue ta.)

15 Ọ bu kwa Makia ka m’nyere Gilead.

16 M’we nye ndi Reuben nye kwa ndi Gad site na Gilead we rue ndagwurugwu Anon, bú etiti ndagwurugwu ahu, ka ọ buru ókè-ala; we rue miri-iyi Jabok, bú ókè-ala umu Amon;

17 na Araba, na Jọdan, ka ọ buru ókè-ala, site na Kineret we rue oké osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú, n’okpuru nkpọrube Pisga, n’akuku ọwuwa-anyanwu.

18 M’we nye unu iwu na mb͕e ahu, si, Jehova, bú Chineke-unu, enyewo unu ala nka inweta ya: na njikere-agha ka unu gāgabiga n’iru umu-nne-unu, bú umu Israel, unu ndi-dìnkpà nile.

19 Ọ bu nání na ndinyom-unu, na umu-ntakiri-unu, na anu-ulo-unu, (amawom na unu nwere ọtutu anu-ulo,) gānọdu n’obodo-unu nke m’nyeworo unu;

20 rue mb͕e Jehova gēme ka umu-nne-unu zuru ike, dika O mere unu, ha onwe-ha we nweta kwa ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye ha n’ofè Jọdan: unu we laghachi, nwoke ọ bula rue ihe-nnweta-ya, nke m’nyeworo unu.

21 Joshua ka m’nye-kwa-ra iwu na mb͕e ahu, si, Anya-gi abua nāhu ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, meworo eze abua ndia: otú a ka Jehova gēme ala-eze nile ebe gi onwe-gi nāgabiga.

22 Unu atula egwu ha: n’ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu onye nēburu unu agha.

23 M’we riọ Jehova amara na mb͕e ahu, si,

24 Onye-nwe-ayi, Jehova, Gi onwe-gi amalitewo ime ka orù-Gi hu idi-uku-Gi, na aka-Gi di ike: n’ihi na òle chi di n’elu-igwe ma-ọbu n’uwa, nke nēme dika omume-Gi nile si di, na dika idi-ike-Gi nile si di?

25 Biko, ka m’gabiga, hu ezi ala ahu nke di n’ofè Jọdan, ezi ugwu ahu, na Lebanon.

26 Ma Jehova webigara iwe ókè n’arum n’ihi unu, O geghi-kwam nti: Jehova we sim, O zuwo gi; agwa-kwa-lam okwu bayere ihe a ọzọ ma-ọli.

27 Rigo n’elu Pisga, welie anya-gi abua le akuku Ọdida-anyanwu, na akuku Ugwu na akuku Ndida, na akuku ọwuwa-anyanwu, were kwa anya-gi abua le: n’ihi na i gaghi-agabiga Jọdan nka.

28 Nye kwa Joshua iwu, me kwa ya ka ọ di ike, b͕a kwa ya ume: n’ihi na ya onwe-ya gāgabiga n’iru ndi nka, ya onwe-ya gēme kwa ka ha keta ala ahu nke i nāhu.

29 Ayi we nọdu na ndagwurugwu na ncherita-iru Bet-peoa.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 4

1 Ma ub͕u a, Israel, ge nti ukpuru nile, ge kwa nti ikpé nile, nke mu onwem nēzí unu, ime ha; ka unu we di ndu, we ba, nweta kwa ala ahu nke Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, nēnye unu.

2 Unu atukwasila ihe n’okwu ahu nke mu onwem nēnye unu n’iwu, unu agubì-kwa la ihe nime ya, idebe ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n’iwu, bú nke mu onwem nēnye unu n’iwu.

3 Anya-unu nāhu ihe ahu nke Jehova mere n’okwu Beal-peoa: n’ihi na nwoke ọ bula nke jesoro Beal-peoa, Jehova, bú Chineke-gi, ekpochapuwo ya n’etiti gi.

4 Ma unu onwe-unu ndi nārapara n’aru Jehova, bú Chineke-unu, unu nādi ndu ta, unu nile.

5 Le, ezíwom unu ukpuru di iche iche na ikpé di iche íche, dika Jehova, bú Chinekem, nyerem iwu, ka unu we me otú a n’etiti ala ahu ebe unu onwe-unu nābà inweta ya.

6 Debe-kwa-nu ha, me kwa ha; n’ihi na nka bu amam-ihe-unu na nghọta-unu n’anya ndi nile, ndi gānu ukpuru ndia nile, we si, Otú ọ di, ndi mara ihe na ndi nwere nghọta ka mba uku a bu.

7 N’ihi na òle mba uku di, nke nwere chi di ya nso dika Jehova, bú Chineke-ayi, si di n’ihe nile ayi kpọkuworo Ya?

8 Òle mba uku di kwa, nke nwere ukpuru na ikpé ziri ezi dika iwu a nile, nke Mu onwem nētiye n’iru unu ta?

9 Nání lezie onwe-gi anya, debe kwa nkpuru-obi-gi nke-ọma, ka i ghara ichezọ ihe nile nke anya-gi abua huworo, ka ha ghara kwa isi n’obi-gi wezuga onwe-ha ubọchi nile nke ndu-gi; kama gi me ka umu-gi na umu umu-gi mara ha;

10 ubọchi nke i guzoro n’iru Jehova, bú Chineke-gi, nime Horeb, mb͕e Jehova sirim, Kpọkọtaram ndim, M’gēme kwa ka ha nu okwum nile, ka ha we muta itu egwum ubọchi nile nke ha onwe-ha nādi ndu n’elu ala, ka ha we zí kwa umu-ha.

11 Unu we biaru nso, guzo n’okpuru ugwu ahu; ugwu ahu nēre ọku rue obi elu-igwe, n’ọchichiri, na igwe-oji, na oké ọchichiri.

12 Jehova we si n’etiti ọku ahu gwa unu okwu: ọ bu olu okwu ka unu onwe-unu nānu, ma ọdighi onye unu nāhu anya; nání olu.

13 Ọ we gosi unu ọb͕ub͕a-ndu-Ya, nke Ọ nyere unu iwu ime, bú okwu iri ahu; Ọ we de ha n’elu mbadamba nkume abua.

14 Ọ bu kwa mu ka Jehova nyere iwu na mb͕e ahu izí unu ukpuru di iche iche na ikpé di iche iche, ka unu we me ha n’ala ahu ebe unu nāgabiga inweta ya.

15 Lezi-kwa-nu nkpuru-obi-unu anya nke-uku; n’ihi na unu ahughi udi ọ bula n’ubọchi Jehova si n’etiti ọku ahu gwa unu okwu na Horeb:

16 ka unu we ghara ibibi onwe-unu, we mere onwe-unu arusi apiri api, bú udi nke oyiyi-ihe, ihe-atù nke oké ma-ọbu nwunye,

17 ihe-atù nke anumanu ọ bula nke di n’uwa, ihe-atù nke nnunu ọ bula nke nwere nkù nke nēfe n’elu-igwe,

18 ihe-atù nke ihe ọ bula nke nākpu akpu n’ala, ihe-atù nke azù ọ bula nke di na miri n’okpuru uwa:

19 ka i we ghara kwa iweli anya-gi abua le elu-igwe, hu anyanwu na ọnwa na kpakpando, bú usu nile nke ihe elu-igwe, ewe duhie gi, i we kpọ isi ala nye ha, fè ha, bú ihe nke Jehova, bú Chineke-gi, kesaworo ndi nile n’okpuru elu-igwe nile.

20 Ma Jehova ewerewo unu, me ka unu si n’oké ọku ígwè ahu, bú Ijipt, puta, iburu Ya ndi nketa, otú ọ di ta.

21 Jehova wesa-kwa-ram iwe n’ihi okwu-unu, we ṅua iyi na m’gaghi-agabiga Jọdan, na m’gaghi-abà kwa n’ezi ala ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa:

22 ma mu onwem gaje inwu n’ala nka, adighm-agabiga Jọdan: ma unu onwe-unu nāgabiga, unu gēnweta kwa ezi ala ahu.

23 Lezienu onwe-unu anya, ka unu ghara ichezọ ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-unu, nke unu na Ya b͕ara, unu we mere onwe-unu arusi apiri api, bú udi ihe ọ bula nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu bayere ya, si, Emela.

24 N’ihi na Jehova, bú Chineke-gi, ọku nēripia eripia ka ọ bu, Chineke ekworo.

25 Mb͕e i gāmu umu, na umu umu, unu we nọ di anya n’ala ahu, duhie onwe-unu, me arusi apiri api, bú udi ihe ọ bula, i we me ihe ọjọ n’anya Jehova, bú Chineke-gi, ikpasu Ya iwe:

26 emewom ka elu-igwe na uwa b͕agide unu àmà ta, na unu gālapusi n’iyì ngwa ngwa n’ala ahu nke unu nāgabiga Jọdan ibà n’ebe ahu inweta ya; unu agaghi-eme ka ubọchi-unu di anya n’elu ya, kama agēkpochapu unu ekpochapu.

27 Jehova gēme kwa ka unu b͕asa n’etiti ndi nile, unu gāfọdu kwa ndikom ole-na-ole n’etiti mba nile ọzọ, ebe Jehova gēduga unu.

28 Unu gēfè kwa chi n’ebe ahu, ndi bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume, nke nādighi-ahu uzọ, ha adighi-anu kwa ihe, ha adighi-eri ihe, ha adighi-anu kwa ísì.

29 Ma asi na i si n’ebe ahu chọ Jehova, bú Chineke-gi, i gāchọta kwa Ya, mb͕e i were obi-gi nile na nkpuru-obi-gi nile jua ase Ya.

30 Mb͕e nkpab͕u diri gi, mb͕e ihe nile ndia abiakwasiwo-kwa-ra gi, na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia i gālaghachikuru kwa Jehova, bú Chineke-gi, ge kwa olu-Ya nti:

31 n’ihi na Jehova, bú Chineke-gi, bu Chineke nwere obi-ebere; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-ebibi kwa gi, Ọ gaghi-echezọ kwa ọb͕ub͕a-ndu nke nna-gi-hà, nke Ọ ṅuru ha iyi bayere ya.

32 N’ihi na biko, jua ajuju bayere ubọchi nile gara aga, nke buru gi uzọ, site n’ubọchi mb͕e Chineke kere madu n’elu uwa, site kwa n’otù nsọtu elu-igwe we rue nsọtu elu-igwe ọzọ, ma ihe dika ihe uku a adiwo, ma-ọbu na anuwo ihe di ka ya.

33 Ọ̀di ndi ọ bula nuru olu Chineke ka o nēsi n’etiti ọku kwue okwu, dika gi onwe-gi nuworo, we di ndu?

34 Ma-ọbu Chineke, Ọ̀ nwawo ibà nime otù mba isi n’etiti ya were n’Onwe-ya mba ọzọ, n’ọnwunwa di iche iche, na n’ihe-iriba-ama di iche iche, na n’ihe-ebube di iche iche, na n’agha, na n’aka di ike, na n’ogwe-aka esetiri eseti, na n’oké egwu di iche iche, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-unu, mere unu n’Ijipt n’anya-unu?

35 Emewo ka gi onwe-gi hu ya, ka i we mara na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke; ọ dighi onye ọzọ ma-ọbughi Ya;

36 N’elu-igwe ka O si me ka i nu olu-Ya, ka O we dọ gi aka na nti: n’elu uwa ka O me-kwa-ra gi ka i hu ọku uku Ya; i we nu okwu-Ya nile site n’etiti ọku ahu.

37 Ma n’ihi na Ọ huru nna-gi-hà n’anya, O we rọputa nkpuru-ha nọchiri ha, O we were ike uku Ya me ka i si n’Ijipt puta n’iru Ya;

38 ka O we napu mba uku di kwa ike kari gi ala-ha n’iru gi, ime ka i ba, ka O we nye gi ala-ha ibu ihe-nketa, otú ọ di ta.

39 I mawo kwa ta, cheta-kwa-ra obi-gi, na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke n’elu-igwe di n’elu na n’elu uwa di n’okpuru: ọ dighi onye ọzọ.

40 I gēdebe kwa ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n’iwu, nke Mu onwem nēnye gi n’iwu ta, ka o we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi, ka i we me kwa ka ubọchi-gi di anya n’elu ala ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ubọchi nile.

41 Mb͕e ahu Moses kpaputara obodo atọ n’ofè Jọdan n’uzọ ọwuwa-anyanwu;

42 ka ob͕u-madu we b͕alaga n’ebe ahu, bú onye nēb͕u ab͕ata-obi-ya nāmaghi ama, ma ya onwe-ya akpọghi ya asì na mb͕e gara aga; ka ọ we b͕alaga n’otù nime obodo ahu, we di ndu:

43 bú Biza nime ọzara, n’ala ahu di lari, ka ọ diri ndi Reuben; na Remot nime Gilead, ka ọ diri ndi Gad; na Golan nime Beshan, ka ọ diri ndi Manase.

44 Nka bu kwa iwu ahu nke Moses doro n’iru umu Israel:

45 ndia bu ihe-àmà, na ukpuru, na ikpé, nke Moses gwara umu Israel, mb͕e ha si n’Ijipt puta;

46 n’ofè Jọdan, na ndagwurugwu ahu na ncherita-iru Bet-peoa, n’ala Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon, onye Moses na umu Israel tib͕uru, mb͕e ha si n’Ijipt puta:

47 ha we nweta ala-ya, na ala Og, bú eze Beshan, bú eze abua ndi-Amorait, ndi di n’ofè Jọdan n’uzọ ọwuwa-anyanwu;

48 site n’Aroea, nke di n’usọ ndagwurugwu Anon, we rue ugwu Saion (nke ahu bu Heamon),

49 na Araba nile n’ofè Jọdan n’uzọ ọwuwa-anyanwu, we rue oké osimiri nke Araba, n’okpuru nkpọrube Pisga.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 5

1 Moses we kpọ Israel nile òkù, si ha, Israel, nurunu ukpuru ndia na ikpé ndia nke mu onwem nēkwu na nti-unu ta, ka unu we muta ha, lezi kwa anya ime ha.

2 Jehova, bú Chineke-ayi, b͕ara ndu nye ayi nime Horeb.

3 Ọ bughi nna-ayi-hà ka Jehova b͕ara ọb͕ub͕a-ndu a nye, kama ọ bu ayi, ọbuná ayi onwe-ayi, ndi nọ n’ebe a na ndu ta, ayi nile.

4 Iru na iru ka Jehova kpayere unu uka n’ugwu ahu site n’etiti ọku ahu,

5 (mu onwem nēguzo n’etiti Jehova na unu na mb͕e ahu, igosi unu okwu Jehova: n’ihi na unu turu egwu n’ihi ọku ahu, unu arigoghi kwa n’ugwu ahu;) si,

6 Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, Onye mere ka i si n’ala Ijipt, n’ulo ndi-orù, puta.

7 Gi enwela chi ọzọ tiyerem.

8 Gi emerela onwe-gi arusi apiri api, bú oyiyi nke udi ọ bula nke di n’elu-igwe n’elu, ma-ọbu nke di n’uwa n’okpuru ya, ma-ọbu nke di na miri n’okpuru uwa:

9 gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n’ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta kwa umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì;

10 ma anamemere nnù umu-umu abua na ọgu iri ebere, bú nke ndi nāhum n’anya, nēdebe kwa ihe nile M’nyere n’iwu.

11 Gi eburula aha Jehova, bú Chineke-gi, ime ihe efu; n’ihi na Jehova agaghi-agu onye nēburu aha-Ya ime ihe efu n’onye ikpé nāmaghi.

12 Debe ubọchi-izu-ike, ido ya nsọ, dika Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu.

13 Ubọchi isi ka i gālu ọlu, je ozi-gi nile:

14 ma ubọchi nke-asa bu ubọchi-izu-ike nke Jehova, bú Chineke-gi, nwere: i gaghi-eje ozi ọ bula nime ya, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na ehi-gi, na inyinya-ibu-gi, na anu-ulo-gi nile, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula; ka orù-gi nwoke na orù-gi nwayi we zuru ike dika gi onwe-gi nēzu.

15 I gēcheta kwa na i buri orù n’ala Ijipt, ma Jehova, bú Chineke-gi, were aka di ike, were kwa ogwe-aka eseteri eseti, me ka i si n’ebe ahu puta: n’ihi nka ka Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu idebe ubọchi-izu-ike.

16 Sọpuru nna-gi na nne-gi, dika Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu: ka ubọchi-gi we di anya, ka ọ we di-kwa-ra gi nma, n’elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.

17 Gi eb͕ula madu.

18 Gi akwa-kwa-la iko.

19 Gi ezu-kwa-la ori.

20 Gi ab͕a-kwa-la àmà ugha megide madu-ibe-gi.

21 Gi enwe-kwa-la anya-uku n’ebe nwunye madu-ibe-gi nọ; agu ulo madu-ibe-gi agu-kwa-la gi, ma-ọbu ubi-ya, ma-ọbu orù-ya nwoke, ma-ọbu orù-ya nwayi, ma-ọbu ehi-ya, ma-ọbu inyinya-ibu-ya, ma-ọbu ihe ọ bula nke madu-ibe-gi nwere.

22 Okwu ndia ka Jehova were oké olu gwa nkpọkọta-unu nile n’ugwu ahu site n’etiti ọku ahu, na igwe-oji ahu, na oké ọchichiri ahu: ma Ọ tukwasighi ihe ọzọ. O we dekwasi ha na mbadamba nkume abua, were ha nyem.

23 O rue, mb͕e unu nuru olu ahu site n’etiti ọchichiri ahu na ugwu ahu nēre ọku, na unu biarurum nso, bú ndi-isi nile nke ebo nile unu, na ndi-okenye-unu;

24 unu we si, Le, Jehova, bú Chineke-ayi, emewo ka ayi hu ebube-Ya na idi-uku-Ya, ọ bu kwa olu-Ya ka ayi nuru site n’etiti ọku ahu; ta ka ayi huworo na Chineke nākpayere madu uka, ọ di kwa ndu.

25 Ma ub͕u a, n’ìhi gini ka ayi gānwu? n’ihi na ọku uku a gēripia ayi: ọ buru na ayi onwe-ayi anu kwa olu Jehova, bú Chineke-ayi, ọzọ, ayi gānwu kwa.

26 N’ihi na ònye di n’etiti anu-aru nile, nke nuworo olu Chineke di ndu ka O nēkwu okwu site n’etiti ọku, dika ayi nuru, ọ di kwa ndu?

27 Gi onwe-gi jerue nso, nu kwa ihe nile nke Jehova, bú Chineke-ayi, gēkwu: gi onwe-gi gāgwa kwa ayi ihe nile nke Jehova, bú Chineke-ayi, gāgwa gi; ayi gānu kwa, me ya.

28 Jehova we nu olu okwu nile unu, mb͕e unu gwaram okwu; Jehova we sim, Anuwom olu okwu nile nke ndi nka, nke ha gwaworo gi: ha emewo nke-ọma n’ihe nile ha kwuworo.

29 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nkpuru-obi-ha di ha otú a, itu egwum, na idebe ihe nile M’nyere n’iwu ubọchi nile, ka ọ we diri ha nma, di-kwa-ra umu-ha, rue mb͕e ebighi-ebi!

30 Je, si ha, Laghachirinu onwe-unu n’ulo-ikwū-unu.

31 Ma gi onwe-gi, guzo n’ebe a n’akukum, ka M’gwa kwa gi ihe ahu nile M’nyere n’iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke i gēzí ha, ka ha we me ha n’ala ahu nke Mu onwem nēnye ha ka ha nweta ya.

32 Unu gēlezi kwa anya ime dika Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu iwu: unu ewezugala onwe-unu n’aka-nri ma-ọbu n’aka-ekpe.

33 N’uzọ nile nke Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu n’iwu ka unu ganēje, ka unu we di ndu, ka o we di-kwa-ra unu nma, ka unu we me kwa ka ubọchi-unu di anya n’ala ahu nke unu gēnweta.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 6

1 Ma nka bu ihe ahu enyere n’iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke Jehova, bú Chineke-unu, nyere iwu ka ezí unu, ka unu we me ha n’ala ahu ebe unu onwe-unu nāgabiga inweta ya;

2 ka i we tua egwu Jehova, bú Chineke-gi, idebe ukpuru-Ya nile na ihe nile O nyere n’iwu, nke Mu onwem nēnye gi n’iwu, gi onwe-gi, na nwa-gi, na nwa nwa-gi, ubọchi nile nke ndu-gi; ka ubọchi-gi we di kwa anya.

3 I gānu kwa, Israel, lezi kwa anya ime ya; ka o we diri gi nma, ka unu we ba kwa uba nke-uku, dika Jehova, bú Chineke nna-gi-hà, gwaworo gi okwu, n’ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.

4 Nuru, Israel; Jehova, bú Chineke-ayi, Jehova bu otù:

5 i gēwere kwa obi-gi nile, were kwa nkpuru-obi-gi nile, were kwa ike-gi nile, hu Jehova, bú Chineke-gi, n’anya.

6 Okwu ndia, nke mu onwem nēnye gi n’iwu ta, gādikwasi kwa n’obi-gi:

7 i gējisi kwa ike izí ha-umu-gi, i gēkwu kwa okwu bayere ha mb͕e i nānọdu n’ulo-gi, na mb͕e i nēje ije n’uzọ, na mb͕e i nēdina ala, na mb͕e i nēbili ọtọ.

8 I gēke kwa ha n’elu aka-gi ka ha buru ihe-iriba-ama, ha gābu kwa nkpọ-n’iru n’etiti anya-gi abua.

9 I gēdekwasi kwa ha n’awara-uzọ abua nke ulo-gi, na n’ọnu-uzọ-ama-gi nile.

10 O gēru kwa, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka i ba n’ala ahu nke Ọ ṅuru nna-gi-hà, bú Abraham, na Aisak, na Jekob, iyi, inye gi; obodo uku di iche iche ma-kwa-ra nma, nke i nēwughi,

11 na ulo juputara n’ezi ihe nile, nke i nēmejughi, na olùlù-miri egwuwara egwuwa, nke i nēgwuwaghi, na ubi-vine na osisi olive, nke i nākughi, mb͕e i gēri kwa, afọ eju kwa gi;

12 gi lezie onwe-gi anya, ka i ghara ichezọ Jehova, Onye mere ka i si n’ala Ijipt, si kwa n’ulo ndi-orù, puta.

13 Jehova, bú Chineke-gi, ka i gātu egwu; ọ bu kwa Ya ka i gēfè òfùfè, ọ bu kwa aha-Ya ka i gēwere ṅu iyi.

14 Unu ejesola chi ọzọ, ndi sitere na chi nke ndi ahu ndi nọ unu buruburu;

15 n’ihi na Chineke ekworo ka Jehova, bú Chineke-gi, bu n’etiti gi; ka iwe Jehova, bú Chineke-gi, we ghara idi ọku megide gi, O we kpochapu gi n’elu ala.

16 Unu anwala Jehova, bú Chineke-unu, dika unu nwara Ya nime Masa.

17 Unu gējisi ike idebe ihe ahu nile nke Jehova, bú Chineke-unu, nyere n’iwu, unu gēdebe kwa ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, nke O nyeworo gi n’iwu.

18 I gēme kwa ihe ziri ezi na nke di nma n’anya Jehova: ka o we diri gi nma, ka i we ba kwa, nweta ezi ala ahu, nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi inye ha,

19 ikwapu ndi-iro-gi nile n’iru gi, dika Jehova kwuworo.

20 Mb͕e nwa-gi gāju gi n’ọdi-n’iru, si, Gini bu isi ihe-àmà ndia, na ukpuru ndia, na ikpé ndia, nke Jehova, bú Chineke-ayi, nyeworo unu n’iwu?

21 i gāsi kwa nwa-gi, Ayi buru Fero ndi-orù n’Ijipt; Jehova we were aka di ike me ka ayi si n’Ijipt puta:

22 Jehova we tiyekwasi ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-ebube di iche iche, di uku jọ kwa njọ, n’aru Ijipt, na n’aru Fero, na n’aru ulo-ya nile, n’anya-ayi:

23 ọ bu kwa ayi ka O mere ka ayi si n’ebe ahu puta, ka O we me ka ayi ba nime, ka O we nye ayi ala ahu nke Ọ ṅuru nna-ayi-hà iyi inye ha.

24 Jehova we nye ayi iwu ime ukpuru ndia nile, itu egwu Jehova, bú Chineke-ayi, ka o we diri ayi nma ubọchi-ayi nile, ka O we debe ayi ndu, otú ọ di ta.

25 Ezi omume ka ọ gābu-kwa-ra ayi, mb͕e ayi gēlezi anya ime ihe a nile enyere n’iwu n’iru Jehova, bú Chineke-ayi, dika O nyere ayi iwu.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 7

1 Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka i ba n’ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya, mb͕e Ọ gēwepu kwa ọtutu mba n’iru gi, bu ndi Het, na ndi-Giagashait, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, mba asa bara uba di kwa ike kari gi;

2 mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gāra kwa ha nye n’iru gi, i we tib͕ue ha; i gēwezugasi kwa ha ka ebibie ha; gi na ha ab͕ala ndu, eme-kwa-la ha amara:

3 gi na ha alurita-kwa-la nwunye; enyela nwa-ya nwoke nwa-gi nwayi, ekuru-kwa-la nwa-ya nwayi nye nwa-gi nwoke.

4 N’ihi na ọ gēwezuga nwa-gi nwoke n’isom n’azu, ka ha we fè chi ọzọ: iwe Jehova gādi kwa ọku megide unu, Ọ gēkpochapu kwa gi ngwa ngwa.

5 Kama otú a ka unu gēme ha; unu gākwatu ebe-ichu-àjà nile ha, tupia kwa ogidi nile ha, b͕utu kwa Asherim-ha, sure kwa arusi nile ha apiri api n’ọku.

6 N’ihi na ndi nsọ ka i buru Jehova, bú Chineke-gi: ọ bu gi ka Jehova, bú Chineke-gi, rọputaworo iburu Ya ihe nke aka Ya, kari ndi nile ndi nọ n’elu ala.

7 Ọ bughi na unu bara uba kari ndi nile ka Jehova huru unu n’anya si-ike, we rọputa unu; n’ihi na unu onwe-unu di ole-na-ole kari ndi nile ọzọ:

8 kama ọ bu n’ihi na Jehova huru unu n’anya, na n’ihi na O debere iyi Ọ ṅuru nna-unu-hà, ka Jehova were aka di ike me ka unu puta, O we b͕aputa unu n’ulo ndi-orù, n’aka Fero, bú eze Ijipt.

9 I gāmara kwa na Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya bu Chineke; Chineke ahu Nke kwesiri ntukwasi-obi, nēdebere ndi huru Ya n’anya, ndi nēdebe kwa ihe nile O nyere n’iwu, ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ebere-Ya rue nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri;

10 Ọ nākwughachi kwa ndi nākpo Ya asì n’iru ha, ime ka ha la n’iyì: Ọ gaghi-alara onye nākpọ Ya asì azu, n’iru ya ka Ọ gākwughachi ya.

11 I gēdebe kwa ihe ahu enyere n’iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke mu onwem nēnye gi n’iwu ta, ka i we me ha.

12 Ọ gēru kwa, n’ihi na unu nānu ikpé ndia, debe kwa ha, me kwa ha, na Jehova, bú Chineke-gi, gēdebe-kwa-ra gi ọb͕ub͕a-ndu ahu na ebere ahu nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi imere ha:

13 Ọ gāhu kwa gi n’anya, gọzie gi, me ka i ba uba: Ọ gāgọzi kwa nkpuru nke afọ-gi, na nkpuru nke ala-gi, bú ọka-gi, na manya-vine ọhu gi, na manu-gi, na umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu-gi, n’elu ala ahu nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi.

14 Ndi agọziri agọzi ka i gābu kari ndi nile ọzọ: nwoke nēnweghi ike imu nwa na nwayi-àgà agaghi-adi n’etiti gi, ma-ọbu n’etiti anu-ulo-gi.

15 Jehova gēwezuga kwa n’aru-gi ọria nile; nriaria ọjọ nile nke Ijipt nke i maworo, Ọ gaghi-atukwasi kwa ha n’aru-gi, ma Ọ gētiye ha n’aru ndi nākpọ gi asì.

16 I gēripia kwa ndi ahu nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi; anya-gi agaghi-emere ha ebere: efè-kwa-la chi-ha di iche iche òfùfè; n’ihi na ọnyà ka ọ gāburu gi.

17 Mb͕e i gāsi n’obi-gi, Mba ndia bara uba karim; #m’gēsi aṅa pu inapu ha ala-ha?

18 atula egwu ha: i gēcheta nke-ọma ihe nke Jehova, bú Chineke-gi, mere Fero, me kwa Ijipt nile;

19 ọnwunwa uku nile nke anya-gi huru, na ihe-iriba-ama nile, na ihe-ebube nile, na aka ahu di ike, na ogwe-aka ahu esetiri eseti, nke Jehova, bú Chineke-gi, ji me ka i puta: otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, gēme ndi ahu nile ndi gi onwe-gi nātu egwu ha.

20 Ọzọ kwa, ọ bu ebu ka Jehova, bú Chineke-gi, gēsì n’etiti ha, rue mb͕e ndi fọduru, ndi nēzopu kwa onwe-ha n’iru gi, gāla n’iyì.

21 Amala jijiji n’iru ha: n’ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọ n’etiti gi, Ọ bu Chineke uku, di kwa egwu.

22 Ma Jehova, bú Chineke-gi, gēwepu mba ahu n’iru-gi nke-ntà nke-ntà: i pughi ime ka ha gwusia ngwa ngwa, ka anu-ọhia ghara iba uba megide gi.

23 Ma Jehova, bú Chineke-gi, gāra ha nye n’iru gi, me kwa ka ha b͕a aghara uku, rue mb͕e agēkpochapu ha.

24 Ọ gēnye kwa ndi-eze-ha n’aka-gi, i gēme kwa ka aha-ha lapu n’iyì n’okpuru elu-igwe: ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n’iru gi, rue mb͕e i gēkpochapu ha.

25 Unu gēsure arusi nile apiri api nke chi nile ha n’ọku: enwela anya-uku n’ọla-ọcha na ọla-edo nke di n’aru ha, ewe-kwa-la n’onwe-gi, ka aghara ima gi n’ọnyà nime ya: n’ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ọ bu:

26 eme-kwa-la ka ihe-árú ba n’ulo-gi, i we ghọ ihe ewezugara ka ebibie ya dika ya: i gājusi ya aju, kpọ kwa ya ihe rusiri árú; n’ihi na ihe ewezugara ka ebibie ya ka ọ bu.