Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 4

1 Mb͕e ihe ndia gasiri m’we hu, ma le, ọnu-uzọ ka o gheworo oghe n’elu-igwe, olu mbu m’nu-kwa-ra, olu dika nke opì nākpayerem uka, otù onye nāsi, Rigota n’ebe a, M’gēgosi kwa gi ihe nile nke nāghaghi iputa mb͕e ihe ndia gasiri.

2 Ngwa ngwa emerem ka m’nọ nime Mọ Nsọ: ma le, edebere oche-eze n’elu-igwe, otù Onye nānọkwasi kwa n’oche-eze ahu;

3 Onye ahu Nke nānọdu ala yiri nkume jasper na sardius ma ọ buru na anēle Ya anya: eke-na-ogwurugwu di kwa oche-eze ahu gburugburu, yiri emerald ma ọ buru na anēle ya anya.

4 Orú oche-eze na anọ di kwa oche-eze ahu gburugburu: m’we hu orú ndi-okenye na anọ ka ha nānọkwasi n’oche-eze ndia, ndi eb͕okwasiworo uwe ọcha; ahu-kwa-ram okpu-eze nke ọla-edo n’isi-ha.

5 Àmùmà na olu na éb͕è-elu-igwe nēsi kwa n’oche-eze ahu puta. Ọwa nke ọku asa nēnwu n’iru oche-eze ahu, nke bu Mọ asa ahu nke Chineke;

6 ihe di kwa n’iru oche-eze ahu dika oké osimiri eji enyo me yiri crystal; ihe anọ nke di ndu nọ kwa n’etiti oche-eze ahu, nọ kwa oche-eze ahu gburugburu, ndi juputara n’anya anya n’iru na azu.

7 Ihe mbu ahu nke di ndu yiri ọdum, ihe nke-abua ahu nke di ndu yi-kwa-ra nwa-ehi, ihe nke-atọ ahu nke di ndu nwe-kwa-ra iru dika nke madu, ihe nke-anọ ahu nke di ndu yi-kwa-ra ugo nēfe efe.

8 Ihe anọ ahu nke di ndu nwe-kwa-ra nkù isi n’otù n’otù, ha juputa-kwa-ra n’anya anya gburugburu, ya na nime: ha adighi-ezu ike ehihie na abali, nāsi, Nsọ, nsọ, nsọ, ka Onye ahu di, bú Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Onye diri, Onye nādi kwa adi, Onye nābia kwa.

9 Mb͕e ọ bula ihe anọ ahu nke di ndu gēnye Onye ahu Nke nānọkwasi n’oche-eze ahu otuto na nsọpuru na ekele, bú Onye nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi,

10 orú ndi-okenye na anọ ahu gāda n’ala n’iru Onye ahu Nke nānọkwasi n’oche-eze ahu, ha gākpọ kwa isi ala nye Ya, bú Onye ahu Nke nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, ha gātudà kwa okpu-eze-ha n’iru oche-eze ahu, nāsi,

11 Gi, Onye-nwe-ayi na Chineke-ayi, I kwesiri inara otuto nile na nsọpuru nile na ike nile: n’ihi na Gi onwe-gi kère ihe nile, ọ bu kwa n’ihi ọchichọ-Gi ka ha diri, ka ekè-kwa-ra ha èkè.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 5

1 M’we hu akwukwọ nke edere ya-ri ihe n’ime na azu, nke eji-kwa-rari akàrà asa kasie ya ike, ka ọ di n’aka-nri Onye ahu Nke nānọkwasi n’oche-eze ahu.

2 M’we hu mọ-ozi di ike, ka o nēwere oké olu nēkwusa, si, Ònye kwesiri isaghe akwukwọ ahu, na inyawapu akàrà-ya?

3 Ọ dighi kwa onye ọ bula di n’elu-igwe, ma-ọbu n’elu uwa, ma-ọbu n’okpuru uwa, puru isaghe akwukwọ ahu, ma-ọbu ile ya anya.

4 M’we kwa ákwá nke-uku, n’ihi na ahughi onye ọ bula kwesiri isaghe akwukwọ ahu, ma-ọbu ile ya anya:

5 otù onye n’etiti ndi-okenye ahu we sim, Akwala ákwá: le, Ọdum ahu Nke si n’ebo Juda puta, Onye bu Nkpọrọgwu nke Devid, O kwesiri, isaghe akwukwọ ahu na akàrà-ya asa.

6 M’we hu Nwa-aturu ka O nēguzo n’etiti oche-eze ahu na ihe anọ ahu nke di ndu, guzo kwa n’etiti ndi-okenye ahu, dika agāsi na eb͕uru Ya-ri, O nwe-kwa-ra mpi asa, na anya asa, nke bu Mọ asa ahu nke Chineke, bú nke ezigaworo ha n’uwa nile.

7 O we bia, Ọ narawo kwa akwukwọ ahu n’aka-nri Onye ahu Nke nānọkwasi n’oche-eze ahu.

8 Mb͕e Ọ natara akwukwọ ahu, ihe anọ ahu nke di ndu na orú ndi-okenye na anọ ahu we da n’ala n’iru Nwa-aturu ahu, ha nile n’otù n’otù nwere ubọ-akwara, na ọkwa nke eji ọla-edo me nke juputara n’ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nke bu ekpere ndi nsọ.

9 Ha nābù kwa abù ọhu, si, I kwesiri inata akwukwọ ahu, na isaghe akàrà-ya: n’ihi na eb͕uru Gi eb͕u, I were kwa ọbara-Gi b͕atara Chineke madu si n’ebo nile ọ bula, na asusu nile ọ bula, na ndi nile ọ bula, na mba nile ọ bula, puta,

10 I we me ha ka ha buru ala-eze na ndi-nchu-àjà nye Chineke-ayi; ha bu kwa eze n’elu uwa.

11 M’we hu, nu kwa olu ọtutu ndi-mọ-ozi ndi nọ oche-eze ahu na ihe anọ ahu nke di ndu na ndi-okenye ahu gburugburu; ọnu-ọgugu-ha riri oké nne nke-uku, nke anāpughi iguta ha;

12 anurum ka ha were oké olu nāsi, O kwesiri, bú Nwa-aturu ahu Nke eb͕uworo eb͕u, inata ike nile, na àkù, na amam-ihe, na ume, na nsọpuru, na otuto, na ngọzi.

13 M’we nu ihe nile ọ bula ekère èkè nke di n’elu-igwe, na n’elu uwa, na n’okpuru uwa, na n’elu oké osimiri, ha na ihe nile di ha nime, ka ha nāsi, Ọ bu Onye ahu Nke nānọkwasi n’oche-eze ahu, Ya na Nwa-aturu ahu, ka ngọzi nile na nsọpuru nile na otuto nile na ike nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi.

14 Ihe anọ nke di ndu we si, Amen. Ndi-okenye ahu we da n’ala we kpọ isi ala.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 6

1 M’we hu mb͕e Nwa-aturu ahu saghere otù nime akàrà asa ahu, m’we nu otù nime ihe anọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, dika agāsi na o ji olu éb͕è-elu-igwe nēkwu, si, Bia.

2 M’we hu, ma le, inyinya ọcha, Onye nānọkwasi ya nwe-kwa-ra uta; ewe nye Ya okpu-eze: O we puta nēmeri, ya na ka O we meri.

3 Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-abua, m’we nu ihe nke-abua ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Bia.

4 Inyinya ọzọ we puta, bú inyinya nke nācha ọku ọku: ewe nye onye nānọkwasi ya ike inapu udo n’uwa, ya na ka ha we b͕urita onwe-ha: ewe nye ya oké mma-agha.

5 Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-atọ, m’we nu ihe nke-atọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Bia. M’we hu, ma le, inyinya oji; onye nānọkwasi ya nwe-kwa-ra ihe-ọtùtù n’aka-ya.

6 M’we nu dika agāsi na ọ bu otu n’etiti ihe anọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Otù ọtùtù ntà nke ọkà bu otù shilling, ọtùtù ntà atọ nke barley bu otù shilling; emejọ-kwa-la manu na manya-vine.

7 Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-anọ, m’we nu olu nke ihe nke-anọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Bia.

8 M’we hu, ma le, inyinya nke aru-ya yiri ozu: onye nānọkwasi kwa ya, aha-ya bu Ọnwu; Hedis we so ya ga. Ewe nye ha ike ichi otù uzọ n’uzọ anọ nke uwa, iji mma-agha, na iji oké unwu, na iji ọnwu, nēb͕u, iwere kwa anu-ọhia nke uwa nēb͕u.

9 Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-ise, m’we hu n’okpuru ebe-ichu-àjà ahu nkpuru-obi nke ndi eb͕ururi n’ihi okwu Chineke, na n’ihi àmà ahu nke ha nwere:

10 ha we were oké olu tie nkpu, si, Rùe ole mb͕e, Onye-nwe-ayi, Onye di nsọ, buru kwa Onye-ezi-okwu, ka I nēkpeghi ikpé bọ̀ kwa ọ́bọ̀ ọbara-ayi n’isi ndi bi n’elu uwa?

11 Ewe nye ha n’otù n’otù uwe-nwuda di ọcha; ewe si ha, ka ha zuru ike nwa oge ọzọ, rue mb͕e ndi-orù-ibe-ha na umu-nna-ha gēzu kwa ezù, bú ndi agaje ib͕u dika eb͕u-kwa-ra ha onwe-ha.

12 M’we hu mb͕e Ọ saghere akàrà nke-isi, oké ala-ọma-jijiji we da; anyanwu we ghọ oji dika ákwà-nkpe nēji nji nke eji aji anu kpa, ewe me ọnwa ka ọ gbaze ka ọbara:

13 kpakpando nile nke elu-igwe we da rue ala, dika osisi fig nātupu nkpuru-ya nāchaghi acha, mb͕e oké ifufe nēfeghari ya.

14 Ewe kewapu elu-igwe dika akwukwọ-odide mb͕e anāpiakọta ya; ewe wepu ugwu nile na agwe-etiti nile ọ bula n’ọnọdu-ha.

15 Ndi-eze nke uwa, na ndi-amadi, na ndi-isi-ọchi-agha, na ndi-ọgaranya, na ndi di ike, na orù ọ bula, na onye ọ bula nwere onwe-ya, we zobe onwe-ha nime ọb͕à na nime oké nkume nke ugwu:

16 ha nāsi kwa ugwu na oké nkume ahu, Dakwasinu ayi, zopu ayi n’iru Onye ahu Nke nānọkwasi n’oche-eze ahu, zopu kwa ayi n’iwe nke Nwa-aturu ahu:

17 n’ihi na oké ubọchi nke iwe-ha abiawo; ònye pu-kwa-ra iguzo?

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 7

1 Mb͕e nka gasiri m’we hu ndi-mọ-ozi anọ ka ha nēguzo n’elu nkuku anọ nke uwa, nējidesi ifufe anọ nke uwa ike, ka ifufe ọ bula we ghara ife n’elu uwa, ma-ọbu n’elu oké osimiri, ma-ọbu n’elu osisi ọ bula.

2 M’we hu mọ-ozi ọzọ ka o nēsi n’ọwuwa-anyanwu rigo, nēnwe akàrà nke Chineke di ndu; o we were oké olu tiere ndi-mọ-ozi anọ ahu nkpu, bú ndi enyere ha ike imejọ uwa na oké osimiri,

3 si, Emejọla uwa, ma-ọbu oké osimiri, ma-ọbu osisi, rue mb͕e ayi gākasiwo ndi-orù Chineke-ayi akàrà n’egedege-iru-ha.

4 M’we nu ọnu-ọgugu ndi akarari, ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ, ndi akarari akàrà site n’ebo nile ọ bula nke umu Israel.

5 Akarari akàrà site n’ebo Juda orú nnù na nnù iri:

Site n’ebo Reuben orú nnù na nnù iri:

Site n’ebo Gad orú nnù na nnù iri:

6 Site n’ebo Asha orú nnù na nnù iri:

Site n’ebo Naftali orú nnù na nnù iri:

Site n’ebo Manase orú nnù na nnù iri:

7 Site n’ebo Simeon orù nnù na nnù iri:

Site n’ebo Livai orú nnù na nnù iri:

Site n’ebo Isaka orú nnù na nnù iri:

8 Site n’ebo Zebulum orú nnù na nnù iri:

Site n’ebo Josef orú nnù na nnù iri:

Site n’ebo Benjamin orú nnù na nnù iri:

9 Mb͕e ihe ndia gasiri m’we hu, ma le, oké ìgwè madu, nke onye ọ bula nāpughi iguta ọnu, ndi si na mba nile ọ bula, na ebo nile, na ndi nile, na asusu nile, puta, nēguzo n’iru oche-eze ahu na n’iru Nwa-aturu ahu, eb͕okwasiworo ha uwe-nwuda di ọcha, igu-nkwu di kwa n’aka-ha;

10 ha we were oké olu tie nkpu, si, Nzọputa diri Chineke-ayi, Onye nānọkwasi n’oche-eze ahu, di-kwa-ra Nwa-aturu ahu.

11 Ndi-mọ-ozi nile nēguzo kwa oche-eze ahu na ndi-okenye ahu na ihe anọ ahu nke di ndu gburugburu; ha we da kpuchie iru-ha n’ala n’iru oche-eze ahu, we kpọ isi ala nye Chineke,

12 si, Amen: Ngọzi nile, na otuto nile, na amam-ihe nile, na ekele nile, na nsọpuru nile, na ike nile, na ume nile, diri Chineke-ayi rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

13 Otù n’etiti ndi-okenye ahu we za, sim, Ndia ndi eb͕okwasiworo uwe-nwuda ahu di ọcha, hà bu ole ndi, òle ebe ha si bia kwa?

14 M’we si ya, Onye-nwem, gi onwe-gi matara. O we sim, Ndia bu ndi nēsi n’oké nkpab͕u ahu puta, ha sa-kwa-ra uwe-nwuda-ha, me kwa ka ha di ọcha nime ọbara Nwa-aturu ahu.

15 N’ihi nka ka ha nọ n’iru oche-eze Chineke; ha nēfè kwa Ya òfùfè ehihie na abali n’ulo nsọ Ya: Onye ahu Nke nānọkwasi n’oche-eze ahu gāb͕asa kwa ulo-ikwū-Ya n’isi-ha.

16 Agu agaghi-agu ha ọzọ, akpiri agaghi-akpọ kwa ha nku ọzọ; anyanwu agaghi-acha kwa ha ọzọ, ma-ọbu okpom-ọku ọ bula:

17 n’ihi na Nwa-aturu ahu Nke nọ n’etiti oche-eze ahu gāzù ha dika aturu, Ọ gēduru kwa ha ga n’isi-iyi nke miri nke ndu: Chineke gēhichapu kwa anya-miri nile ọ bula n’anya-ha.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 8

1 Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-asa, ewe dere ji n’elu-igwe oge ra ka nkera nke otù hour.

2 M’we hu ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nēguzo n’iru Chineke; ewe nye ha opì asa.

3 Mọ-ozi ọzọ we bia guzo n’elu ebe-ichu-àjà ahu, nēnwe ihe nke ọla-edo eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; ewe nye ya ọtutu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ we tukwasi ha n’ekpere ndi nsọ nile nke di n’elu ebe-ichu-àjà ahu nke ọla-edo nke di n’iru oche-eze ahu.

4 Anwuru-ọku nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ ahu soro ekpere ndi nsọ site n’aka mọ-ozi ahu rigo n’iru Chineke.

5 Mọ-ozi ahu we were ihe ahu eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; o we kpojue ya n-ọku nke sitere n’ọku nke ebe-ichu-àjà ahu, we tubà ya n’uwa: éb͕è-elu-igwe, na olu na àmùmà, na ala-ọma-jijiji we so.

6 Ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere opì asa ahu doziri onwe-ha ifù opì.

7 Onye mbu we fùa opì, ákú-miri-ígwé na ọku we so, nke agwarari ọbara, ewe tubà ha n’uwa: ọku we b͕achasia otù uzọ n’uzọ atọ nke uwa, ọku b͕achasi-kwa-ra otù uzọ n’uzọ atọ nke osisi, ọku b͕achasi-kwa-ra ahihia ndu nile.

8 Mọ-ozi nke-abua we fùa opì, ewe tubà ihe dika oké ugwu nke nēre ọku nime oké osimiri: otù uzọ n’uzọ atọ nke oké osimiri we ghọ ọbara;

9 otù uzọ n’uzọ atọ nke ihe nile ekère èkè nke di n’oké osimiri we nwua, bú ihe nwere ndu; emebi-kwa-ra otù uzọ n’uzọ atọ nke ub͕ọ nile.

10 Mọ-ozi nke-atọ we fùa opì, oké kpakpando we site n’elu-igwe da, nke nēre ọku dika ọwa, o we da n’elu otù uzọ n’uzọ atọ nke osimiri nile, da kwa n’elu isi-iyi miri nile;

11 aha anākpọ kwa kpakpando ahu bu Wormwood: otù uzọ n’uzọ atọ nke miri nile we ghọ wormwood; ọtutu madu we site n’iṅu miri ahu nwua, n’ihi na emere ka ha nēlu ilu.

12 Mọ-ozi nke-anọ we fùa opì, ewe tie otù uzọ atọ nke anyanwu ihe, ya na otù uzọ n’uzọ atọ nke ọnwa, na otù uzọ n’uzọ atọ nke kpakpando nile; ka otù uzọ n’uzọ atọ nime ha we b͕a ọchichiri, ka ehihie we ghara kwa iputa ìhè n’otù uzọ n’uzọ atọ nime ya, ka ọchichiri we me kwa otú a.

13 M’we hu, nu kwa otù ugo, ka ọ nēfe n’etiti elu-igwe, were kwa oké olu si, Ahuhu, ahuhu, ahuhu, ka ha gāhu, bú ndi bi n’elu uwa, site n’olu fọduru nke opì ndi-mọ-ozi atọ, ndi gaje ifù opì.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 9

1 Mọ-ozi nke-ise we fùa opì, m’we hu kpakpando nke sitereri n’elu-igwe da n’uwa: ewe nye ya nkpisi-ugodi nke olùlù nke abyss ahu.

2 O we meghe olùlù nke abyss ahu; anwuru-ọku we si n’olùlù ahu kwugo, dika anwuru-ọku nke oké ọku; anyanwu na mbara-elu-igwe we site n’anwuru-ọku nke olùlù ahu b͕a ọchichiri.

3 Igurube we si n’anwuru-ọku ahu puta je n’uwa; ewe nye ha ike, dika akpi nke uwa nwere ike.

4 Ewe gwa ha ka ha ghara imejọ ahihia nke uwa, ma-ọbu ihe ọ bula nwere akwukwọ ndu, ma-ọbu osisi ọ bula, ma ka ha mejọ nání madu, bú ndi ahu nēnweghi akàrà nke Chineke n’egedege-iru-ha.

5 Ewe nye ha ike ka ha ghara ib͕u ha, kama ka ewe mekpa ha aru ọnwa ise: nmekpa-aru-ha di ka nmeka-aru nke akpi, mb͕e ọ bula ọ nāb͕a madu.

6 N’ubọchi ahu madu gāchọ kwa ọnwu, ha agaghi-ahu kwa ya ma-ọli; agu inwu ọnwu gāgu kwa ha, ọnwu we b͕anari ha.

7 Oyiyi igurube ahu yiri inyinya edoziworo ije agha; n’isi-ha ka ha nēkpu ihe dika okpu-eze yiri ọla-edo, iru-ha di kwa ka iru madu.

8 Ha nwe-kwa-ra agiri-isi dika agiri-isi ndinyom, ezé-ha di kwa ka ezé ọdum.

9 Ha nwe-kwa-ra ihe-agha ib͕ochi obi, dika ihe-agha ib͕ochi obi nke ígwè; nkpatu nkù-ha di kwa ka nkpatu nke ub͕ọ-ala, nke ọtutu inyinya nāb͕a ọsọ ije agha.

10 Ha nwe-kwa-ra ọdudù yiri ọdudù akpi, nwe ihe-ọb͕ub͕a; nime ọdudù-ha ike-ha di imejọ madu ọnwa ise.

11 Ha nwere mọ-ozi ahu nke abyss ahu dika eze-ha: aha-ya n’asusu Hibru bu Abadon, n’asusu Grik o nwe-kwa-ra aha Apọlion.

12 Ahuhu mbu agabigawo: le, ahuhu abua ọzọ fọduru ibia, mb͕e ihe ndia gasiri.

13 Mọ-ozi nke-isi we fùa opì, m’we nu otù olu nke si na mpi nke ebe-ichu-àjà ahu eji ọla-edo me puta, bú nke di n’iru Chineke,

14 M’we nu otù onye, ka ọ nāgwa mọ-ozi nke-isi ahu okwu, bú onye nwere opì ahu, si, Tọpu ndi-mọ-ozi anọ ahu ndi ekeworo ab͕u n’osimiri uku Yufretis.

15 Ewe tọpu ndi-mọ-ozi anọ ahu, ndi edoziriri nye oge hour na ubọchi na ọnwa na arọ ahu, ka ha we b͕ue otù uzọ n’uzọ atọ nke madu.

16 Ọnu-ọgugu usu-ndi-agha ahu, nke bu ndi-inyinya, di ọgu million iri: anurum ọnu-ọgugu-ha.

17 Otù a ka m’hu-kwa-ra inyinya ahu n’ọhù ahu, ha na ndi nānọkwasi ha, nēnwe ihe-agha ihe-agha ib͕ochi obi nke yiri ọku na hyacinth na brimstone: isi inyinya ahu di kwa ka isi ọdum; ọku na anwuru-ọku na brimstone nēsi kwa n’ọnu-ha puta.

18 Esitere n’ihe-otiti atọ ndia b͕u otù uzọ n’uzọ atọ nke madu nile, ya bu site n’ọku ahu na anwuru-ọku ahu na brimstone ahu, nke nēsi n’ọnu-ha puta.

19 N’ihi na ike inyinya ahu di n’ọnu-ha, di kwa n’ọdudù-ha: n’ihi na ọdudù-ha yiri agwọ, nwe kwa isi; ha were kwa ha nēmejọ.

20 Ma ndi fọduru n’etiti madu, ndi anēb͕ughi n’ihe-otiti ndia, echègharighi isi n’ọlu nile nke aka-ha puta, ka ha we ghara ikpọ isi ala nye ndi-mọ ọjọ, ha na arusi-ha nke ọla-edo, na nke ọla-ọcha, na nke ọla, na nke nkume, na nke osisi; nke nāpughi ile ihe anya, ma-ọbu inu ihe, ma-ọbu ije ije:

21 ha echègharighi kwa isi n’ib͕u-madu-ha, ma-ọbu n’igwọ-nsi-ha, ma-ọbu n’ikwa-iko-ha, ma-ọbu n’izu-ori-ha, puta.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 10

1 M’we hu mọ-ozi ọzọ di ike, ka ọ nēsi n’elu-igwe ridata, nke eb͕okwasiworo ya igwe-oji dika uwe; eke-na-ogwurugwu ahu di kwa n’isi-ya, iru-ya di kwa ka anyanwu, ukwu-ya abua di kwa ka ide ọku;

2 ọ nējide kwa nwa akwukwọ ntà n’aka-ya, nke asagheworo: o we tukwasi ukwu aka-nri ya n’elu oké osimiri tukwasi kwa ukwu aka-ekpe ya n’elu ala;

3 o we were oké olu tie nkpu, dika ọdum nāb͕ọ uja: mb͕e o tiri nkpu, éb͕è-elu-igwe asa ahu we kwue olu-ha.

4 Ma mb͕e éb͕è-elu-igwe asa ahu kwuru okwu, agajem ide akwukwọ: m’we nu olu si n’elu-igwe da, si Kà ihe éb͕è-elu igwe asa ahu kwuru akàrà, ede-kwa-la ha n’akwukwọ.

5 Mọ-ozi ahu, nke m’huru ka ọ nēguzo n’elu oké osimiri na n’elu ala, we welie aka-nri-ya zó n’elu-igwe,

6 we were Onye ahu Nke nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, bú Onye kère elu-igwe na ihe nile di ya nime, na uwa na ihe nile di ya nime, na oké osimiri na ihe nile di ya nime, ṅu iyi na oge agaghi-adi kwa ọzọ:

7 ma n’ubọchi nke olu mọ-ozi nke-asa ahu, mb͕e ọ gaje ifù opì, agēme kwa ka ihe-omimi nke Chineke zu okè, dika O zìri ozi ọma nye ndi-orù-Ya, bú ndi amuma-Ya.

8 Olu ahu nke m’nuru ka ọ nēsi n’elu-igwe da, anu-kwa-ram ya ọzọ ka ọ nākpayerem uka, si, Je, nara akwukwọ ahu nke asagheworo, bú nke di n’aka mọ-ozi ahu onye nēguzo n’elu oké osimiri na n’elu ala.

9 M’we jekuru mọ-ozi ahu, si ya ka o nyem nwa akwukwọ ntà ahu. O we sim, Nara ya, ripia kwa ya; ọ gēme kwa ka afọ-gi lue ilu, ma n’ọnu-gi ọ gātọ utọ dika manu-aṅu.

10 M’we nara nwa akwukwọ ntà ahu n’aka mọ-ozi ahu, we ripia ya; o we tọ utọ n’ọnum dika manu-aṅu; mb͕e m’ripiasiri ya, ewe me ka afọm lue ilu.

11 Ha nāsikwam, I ghaghi ibu amumá ọzọ bayere ọtutu ndi na ọtutu mba na ọtutu asūsū na ọtutu eze.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 11

1 Ewe nyem amì yiri nkpa-n’aka: otù onye we si, Bilie, tù kwa ulo nsọ nke Chineke, na ebe-ichu-àjà-ya, na ndi nākpọ isi ala nime ya.

2 Ma obí nke di n’èzí ulo nsọ ahu, rapu ya n’èzí, atù-kwa-la; n’ihi na ewerowo ya nye ndi mba ọzọ: ha gāzọda kwa obodo nsọ ahu ọgu ọnwa abua na abua.

3 M’gēnye kwa ndi-àmàm abua ike, ha gēbu kwa amuma nnù ubọchi atọ na ọgu atọ, eb͕okwasiwo kwa ha ákwà-nkpe.

4 Ndia bu osisi olive abua ahu na ihe-idọba-oriọna abua ahu, ndi nēguzo n’iru Onye-nwe uwa.

5 Ọ buru kwa na onye ọ bula chọrọ imejọ ha, ọku nēsi n’ọnu-ha puta, nēripia kwa ndi-iro-ha; ọ buru kwa na onye ọ bula gāchọ imejọ ha, aghaghi ib͕u ya otú a.

6 Ndia nwere ike imechi elu-igwe, ka miri we ghara izo n’ubọchi nile nke amuma-ha: ha nwe-kwa-ra ike n’ebe miri nile di, ime ka ha b͕anwè ọbara, na iwere ihe-otiti nile ọ bula tie uwa, ka mb͕e ha gāchọ ra.

7 Ma mb͕e ọ bula ha gāb͕azuwo àmà-ha, anu-ọhia ahu nke nēsi n’abyss ahu rigoputa gēbu agha megide ha, meri kwa ha, b͕u kwa ha.

8 Ozu-ha we di n’amá nke obodo uku ahu, bú nke anākpọ Sọdọm na Ijipt n’uzọ nke Mọ Nsọ, ebe akpọgide-kwa-ra Onye-nwe-ha n’obe.

9 Madu we si n’etiti ndi nile na ebo nile na asusu nile na mba nile puta nēle ozu-ha ubọchi atọ na nkera otù ubọchi, ha ekweghi kwa ka atọb͕ọ ozu-ha n’ílì.

10 Ndi bi n’elu uwa nāṅuri kwa ọṅu n’isi ha, obi nātọ kwa ha utọ; ha gēzigarita kwa onwe-ha onyinye; n’ihi na ndi-amuma abua ndia mekpara ndi bi n’elu uwa aru.

11 Mb͕e ubọchi atọ na nkera otù ubọchi ahu gasiri Mọ nke ndu nke si na Chineke puta we bata nime ha, ha we guzo n’ukwu-ha; oké egwu we dakwasi ndi nēkiri ha.

12 Ha we nu oké olu nke si n’elu-igwe da, ka ọ nāsi ha, Rigotanu n’ebe a. Ha we rigo rue n’elu-igwe nime igwe-oji ahu; ndi-iro-ha kiri-kwa-ra ha.

13 N’otù oge hour ahu oké ala-ọma-jijiji we da, otù uzọ n’uzọ iri nke obodo ahu we da rue ala; ewe b͕ue nnù madu iri na nnù asa na ọgu iri nime ala-ọma-jijiji ahu, bú ndi nwere aha: ndi fọduru we tua egwu, ha we nye Chineke nke elu-igwe otuto.

14 Ahuhu nke-abua agabigawo: le, Ahuhu nke-atọ nābia ọsọsọ.

15 Mọ-ozi nke-asa we fùa opì; oké olu we da n’elu-igwe, ha we si, Ala-eze nke uwa aghọwo ala-eze nke Onye-nwe-ayi, na nke Kraist-Ya: Ọ gābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.

16 Orú ndi-okenye na anọ ahu, ndi nānọdu n’iru Chineke n’elu oche-eze-ha, we da kpuchie iru ha n’ala, we kpọ isi ala nye Chineke,

17 si, Ayi nēkele Gi, Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Onye nādi adi, Onye di-kwa-ri; n’ihi na I werewo oké ike-Gi, I bukwa eze.

18 Mba nile we we iwe, iwe-Gi we bia, ya na oge ikpe ndi nwuru anwu ikpé, na inye ndi-orù-Gi, bú ndi-amuma, na ndi nsọ, na ndi nātu egwu aha-Gi, ndi ntà na ndi uku, ugwọ-ọlu-ha; na imebi ndi ahu nēmebi uwa.

19 Ewe meghe ulo nsọ nke Chineke nke di n’elu-igwe; ewe hu ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu-Ya n’ulo nsọ Ya; àmùmà, na olu, na éb͕è-elu-igwe, na ala-ọma-jijiji, na oké ákú-miri-ígwé we so.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 12

1 Ewe hu oké ihe-iriba-ama n’elu-igwe; nwanyi nke egbokwasiworo ya anyanwu dika uwe, ọnwa di kwa n’okpuru ukwu-ya abua, ọ nēkpu kwa okpu-eze nke kpakpando iri na abua n’isi-ya;

2 ọ di kwa ime: o we tie nkpu, ebe ime nēme ya, anēmekpa kwa ya aru imuputa nwa.

3 Ewe hu ihe-iriba-ama ọzọ n’elu-igwe; ma le, oké dragon nke nācha ọku ọku, nke nwere isi asa na mpi iri, nēkpu kwa okpu-eze asa n’isi-ya.

4 Ọdudù-ya nādọrọ kwa otù uzọ n’uzọ atọ nke kpakpando nke elu-igwe, o we tudà ha n’ala: dragon ahu we guzo n’iru nwanyi ahu onye gaje imuputa nwa, ka o we ripia Nwa-ya mb͕e ọ bula ọ gāmuputa Ya.

5 O we muputa Ọkpara, bú Nwa-nwoke, Onye gēji nkpa-n’aka ígwè zù mba nile dika aturu: ewe punara ya Nwa-ya ahu la n’ebe Chineke nọ, na n’ebe oche-eze-Ya di.

6 Nwanyi ahu we b͕alaga nime ọhia, ebe o nwere ọnọdu edoziworo site n’aka Chineke, ka ha we zùa ya n’ebe ahu nnù ubọchi atọ na ọgu atọ.

7 Agha we puta n’elu-igwe: Maikael na ndi-mọ-ozi-ya buru agha megide dragon ahu; dragon ahu na ndi-mọ-ozi-ya we bue agha;

8 ha enweghi kwa ike, ahughi kwa ọnọdu-ha ọzọ n’elu-igwe.

9 Ewe chudà dragon uku ahu, bú agwọ ochie ahu, onye anākpọ Ekwensu na Setan, onye nēduhie uwa nile madu bi; achudara ya n’uwa, chudà kwa ndi-mọ-ozi-ya, ha na ya.

10 M’we nu oké olu ka ọ nādà n’elu-igwe, si, Ub͕u a ka ọ biaworo, bú nzọputa ahu, na ike ahu, na ala-eze Chineke-ayi, na ichi-isi nke Kraist-Ya: n’ihi na achudara onye ahu nke nēbo umu-nna-ayi ebubo, onye nēbo ha ebubo n’iru Chineke-ayi ehihie na abali.

11 Ndi ahu we merie ya n’ihi ọbara Nwa-aturu ahu, na n’ihi okwu àmà-ha; ha ahughi kwa ndu-ha n’anya rue ọnwu.

12 N’ihi nka, ka obi nātọ unu utọ, unu elu-igwe nile, na unu ndi bi nime ha. Ahuhu gādiri uwa na oké osimiri: n’ihi na ekwensu aridakuruwo unu, nēnwe oké ọnuma, ebe ọ matara na o nwere nání nwa oge.

13 Mb͕e dragon ahu huru na achudara ya-ri n’uwa, o we sob͕ue nwanyi ahu, bú nwanyi nke muputara Nwa-nwoke ahu.

14 Ewe nye nwanyi ahu nkù abua ahu nke oké ugo ahu, ka o we febà n’ọhia la n’ọnọdu-ya, ebe anāzù ya otù oge, na oge abua, na nkera otù oge, ka ọ pua n’iru agwọ ahu.

15 Agwọ ahu we b͕uputa miri n’ọnu-ya n’azu nwanyi ahu dika osimiri, ka o we me ka osimiri ahu bupu ya.

16 Ala we yere nwanyi ahu aka, ala we saghe ọnu-ya, loda osimiri ahu, nke dragon ahu b͕uputara n’ọnu-ya.

17 Dragon ahu we wesa nwanyi ahu iwe, we pua ibu agha megide nkpuru-ya fọduru, bú ndi nēdebe ihe nile Chineke nyere n’iwu, ndi nēnwe kwa àmà nke Jisus:

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 13

1 o we guzọ n’ájá oké osimiri.

M’we hu anu-ọhia ka ọ nēsi n’oké osimiri rigoputa, nēnwe mpi iri na isi asa, nēkpu kwa okpu-eze iri n’elu mpi-ya, nēnwe kwa aha ufọdu nke nkwulu Chineke n’elu isi-ya.

2 Anu-ọhia nke m’huru yi-kwa-ra agu, ukwu-ya di kwa ka ukwu bear, ọnu-ya di kwa ka ọnu ọdum: dragon ahu we nye ya ike-ya, na oche-eze-ya, na oké ichi-isi.

3 M’we hu otù n’etiti isi asa ya, dika agāsi na etib͕uru ya-ri ọ nwua; ewe me ka ihe-otiti-ya ahu nke nēweta ọnwu la: o we ju uwa dum anya, ha we so anu-ọhia ahu n’azu;

4 ha we kpọ isi ala nye dragon ahu, n’ihi na o nyere anu-ọhia ahu ichi-isi-ya; ha kpọ-kwa-ra isi ala nye anu-ọhia ahu, si, Ònye yiri anu-ọhia ahu? ònye pu-kwa-ra ibu agha megide ya?

5 ewe nye ya ọnu nke nēkwu oké ihe n’ikwulu Chineke; ewe nye ya ike ime omume-ya ọgu ọnwa abua na abua.

6 O we saghe ọnu-ya ikwulu Chineke, ikwulu aha-Ya, na ulo-ikwū-Ya, bú ndi bi n’elu-igwe.

7 Ewe nye ya ike ibu agha megide ndi nsọ ahu, na imeri ha: enye-kwa-ra ya ike ichi ebo nile ọ bula na ndi nile ọ bula na asusu nile ọ bula na mba nile ọ bula isi.

8 Ndi nile ndi bi n’elu uwa gākpọ kwa isi ala nye ya, onye ọ bula anēdeghi aha-ya n’akwukwọ nke ndu nke Nwa-aturu ahu Onye eb͕uworo site n’oge itọ ntọ-ala nke uwa.

9 Ọ buru na onye ọ bula nwere nti, ya nu.

10 Ọ buru na ọ diri onye ọ bula ka adọta ya n’agha, ọ bu n’agha ka agādọta ya: ọ buru na onye ọ bula gēji mma-agha b͕u madu, aghaghi iji mma-agha b͕u ya. Nebe a ka ntachi-obi na okwukwe nke ndi nsọ di.

11 M’we hu anu-ọhia ọzọ ka ọ nēsi n’ala rigoputa; o nwe-kwa-ra mpi abua yiri nke Nwa-aturu ahu, ma ọ nēkwu okwu dika dragon ahu.

12 O we nāchi isi nile nke anu-ọhia mbu ahu n’iru ya. Ọ nēme kwa uwa na ndi bi nime ya ka ha kpọ isi ala nye anu-ọhia mbu ahu, nke emere ka ihe-otiti-ya nke nēweta ọnwu la.

13 ọ nēme kwa oké ihe-iriba-ama di iche iche, ka o we me ọbuná ọku ka o si n’elu-igwe ridata n’uwa n’iru madu nile.

14 O we nēduhie ndi bi n’elu uwa n’ihi ihe-iriba-ama nile nke enyere ya ike ime n’iru anu-ọhia ahu; nāsi ndi bi n’elu uwa, ka ha kpuara anu-ọhia ahu ihe-oyiyi, bú nke nwere ob͕ub͕u-mma-agha ahu, we di ndu.

15 Ewe nye ya ike inye ya ume, bú ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu, ka ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu we kwue okwu, me kwa ka eb͕ue ha, ka ha ra, bú ndi ọ bula nākpọghi isi ala nye ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu.

16 Ọ nēme kwa madu nile, ndi ntà na ndi uku, na ndi-ọgaranya na ndi-ob͕eye, na ndi nwere onwe-ha na ndi-orù, ka akà ha akàrà n’aka-nri-ha, ma-ọbu n’egedege-iru-ha;

17 ka onye ọ bula ghara kwa ipu izuta ahia ma-ọbu ire ihe, ma-ọbughi onye nwere akàrà ahu, bú aha nke anu-ọhia ahu ma-ọbu ọnu-ọgugu aha-ya.

18 N’ebe a ka amam-ihe di. Onye nwere uche, ya gua ọnu-ọgugu nke anu-ọhia ahu; n’ihi na ọ bu ọnu-ọgugu madu: ọnu-ọgugu-ya bu kwa nnù na ọgu iri na ọgu atọ na isi.