Categories
TAITỌS

TAITỌS 2

1 Ma gi onwe-gi, nēkwu ihe nile kwesiri ozizí ahu nke nēnye ezi ndu:

2 si ka agadi-ndikom nwe anya-udo, kwesiri nsọpuru, nwe uche zuru okè, nwe ezi ndu nime okwukwe-ayi, nime ihu-n’anya, nime ntachi-obi:

3 otú ahu ka agadi-ndinyom di nsọ n’omume-ha, ghara ibu ndi nēbo ebubo ugha, ghara kwa ibu orù nke iṅubiga manya ókè, ka ha buru ndi nēzí ihe ọma;

4 ka ha we me ka ndi bu umu-ab͕ọghọ nwe uche zuru okè ibu ndi nāhu di-ha n’anya, ndi nāhu umu-ha n’anya,

5 ndi uche-ha zuru okè, ndi di ọcha, ndi nālu ọlu n’ulo, ezi madu, ndi nēdo onwe-ha n’okpuru di nke aka ha, ka ewe ghara ikwulu okwu Chineke:

6 otú ahu nāriọ umu-okorọbia ka ha nwe uche zuru okè:

7 n’ihe nile nēme onwe-gi ihe-atù nke ọlu ọma; nime ozizí-gi nēgosi emebighi-emebi, ikwesi-nsọpuru,

8 okwu nke nēnye ezi ndu, nke anāpughi ima ikpe; ka ewe me onye nọ n’akuku ndi nēmegide emegide ihe-ihere n’iru, ebe ọ nēnweghi ihe nādighi nma ikwu bayere ayi.

9 Nāriọ ndi-orù ka ha nēdo onwe-ha n’okpuru ndi-nwe-ha, ka ha buru ndi nēme ihe gātọ ha ezi utọ n’ihe nile; ghara ikwu okwu imegide ha;

10 ghara itutu aka, kama ka ha nēgosi ezib͕o ikwesi-ntukwasi-obi nile; ka ha we chọ ozizí nke Onye-nzọputa-ayi Chineke nma n’ihe nile.

11 N’ihi na egosiri amara nke Chineke, nēwetara madu nile nzọputa,

12 nādọ ayi aka na nti ka ayi we ju asọpurughi-Chineke na agu ihe ọjọ di n’uwa, we di ndu uche zuru okè na nke ezi omume na nke isọpuru-Chineke n’oge di ub͕u a;

13 nēche olile-anya ahu di ngọzi na ngosi nke ebube nke Chineke uku ahu, Nke bu kwa Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist;

14 Onye nyere Onwe-ya n’ihi ayi, ka O we b͕aputa ayi n’imebi-iwu nile, sachakwara Onwe-ya otù ndi nke gābu ndi nke aka Ya, ndi obi-ha nānuru ọlu ọma ọku.

15 Nēkwu ihe ndia, were kwa ha nādusi ọdu ike, were kwa ha nātu madu nmehie-ha n’anya, n’inye iwu nile. Ka madu ọ bula ghara ilelì gi anya.

Categories
TAITỌS

TAITỌS 3

1 Nēchetara ha ka ha nēdo onwe-ha n’okpuru ndi-isi, n’okpuru ndi nwere ike, ka ha nēkwenye ekweye, ka ha buru ndi edoziworo ilu ezi ọlu nile ọ bula,

2 ka ha ghara ikwulu onye ọ bula, ghara ibu ndi nālu ọ̀gù, ka ha nwe obi-ọma, nēgosi idi-nwayọ nile n’ebe madu nile nọ.

3 N’ihi na ayi onwe-ayi buru kwa ndi nēnweghi uche n’oge gara aga, ndi nēkweyeghi, ndi anēduhie, ndi bu orù agu ihe ọjọ na ihe-utọ di iche iche, nēbi n’obi ọjọ na ekworo, ndi-ùrú, nākpọrita ibe-ayi asì.

4 Ma mb͕e egosiri obi-ọma nke Onye-nzọputa-ayi Chineke, ya na ihu-n’anya-Ya n’ebe madu nọ,

5 O siteghi n’ọlu di iche iche aluru n’ezi omume, nke ayi onwe-ayi luru, zọputa ayi, kama dika ebere-Ya si di, site n’ọsisa nke imu-ọzọ na nke ime ọhu nke Mọ Nsọ nēme,

6 Onye Ọ wusara ayi nime àkù-Ya nile, site n’aka Jisus Kraist Onye-nzọputa-ayi;

7 ka, ebe ewere amara-Ya gua ayi na ndi ezi omume, ka ayi we ghọ ndi-nketa dika olile-anya nke ndu ebighi-ebi si di.

8 Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, anamezube kwa ka i kwusie okwu bayere ihe ndia ike, ka ndi kweworo okwu Chineke we tukwasi uche n’ibu ndi-isi n’ọlu ọma. Ihe ndia di nma buru kwa ihe bara madu urù:

9 ma nēze ajuju nzuzu nile, na osuso-ọmumu nile, na esem-okwu nile, na ilu-ọ̀gù nile bayere iwu; n’ihi na ha bu ihe nābaghi urù na ihe-efu.

10 Ju madu nke nārọ òtù, mb͕e i dusiri ya ọdu nke-mbu na nke-abua;

11 ebe i matara na atughariwo obi madu di otú a, ọ nēmehie kwa, ebe ọ bu onye mara onwe-ya ikpé.

12 Mb͕e ọ bula m’gēzitere gi Atemas, ma-ọbu Tikikọs, were inu-ọku-n’obi biakutem rue Naikọpọlis: n’ihi na n’ebe ahu ka m’zubeworo inọgide na mb͕e oyi.

13 Were inu-ọku-n’obi dupu Zinas onye-iwu na Apọlos n’ije-ha, ka ihe ọ bula ghara ifọdu nke ha nēnweghi.

14 Ka ndi-ayi muta kwa ibu ndi-isi n’ọlu ọma ib͕o nkpà nākpa umu-nna-ayi, ka ha ghara ibu ndi nāmighi nkpuru.

15 Ndi nile mu na ha nọ nēkele gi. Kele ndi huru ayi n’anya n’okwukwe.

Ka amara dinyere unu nile.

Categories
FAILIMON

FAILIMON 1

1 Pọl, onye-nkpọrọ nke Kraist Jisus, na Timọti nwa-nna-ayi nēdegara Failimon akwukwọ, bú onye ayi huru n’anya, onye ayi na ya nālukọ kwa ọlu,

2 nēdega-kwa-ra Apfia nwa-nna-ayi nwanyi, na Akipọs onye ayi na ya nēbukọ agha, na nzukọ Kraist di n’ulo-gi:

3 Amara diri unu na udo nke si n’aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.

4 Anamekele Chinekem mb͕e nile mb͕e m’necheta gi n’ekperem nile,

5 ebe m’nānu okwu bayere ihu-n’anya-gi na okwukwe-gi, bú okwukwe i kwere n’Onye-nwe-ayi Jisus, na ihu-n’anya i huru ndi nsọ nile;

6 ekpere m’nēkpe bu ka nnwekọ nke okwukwe-gi we ghọ ihe nālusi ọlu ike, nime nmazu nke ezi ihe nile ọ bula nke di nime ayi, rue na Kraist.

7 N’ihi na enwerem ọtutu ọṅù na nkasi-obi n’ihi ihu-n’anya-gi, n’ihi na obi ndi nsọ ezuwo ike site n’aka-gi, nwa-nnam.

8 N’ihi nka, ọ bu ezie na enwerem oké nkwuwa-okwu nime Kraist iwere ihe nke kwesiri nye gi n’iwu,

9 ma n’ihi ihu-n’anya ahu ọ kam nma iriọ aririọ, ebe m’bu nání aha madu dika Pọl, bú agadi, buru kwa onye-nkpọrọ nke Kraist Jisus ub͕u a:

10 ariọm gi aririọ bayere nwa nkem, onye m’muru nime ab͕um, bú Ọnisimọs,

11 onye buri onye nābaghi n’ihe n’ebe i nọ n’oge gara aga, ma ub͕u a ọ bara gi n’ihe, ba-kwa-ram n’ihe:

12 onye m’nēzighachiri gi, ya onye-ya, nke ahu bu, obi nkem:

13 onye mu onwem nēzuberi ijide ka mu na ya nọdu, ka o we nējerem ozi n’ab͕u nke ozi ọma n’ọnọdu gi:

14 ma achọghm ime ihe ọ bula mb͕e i kēkweyeghi; ka idi-nma-gi we ghara idi ka agāsi na ọ di n’uzọ nkpà, kama ka o we di n’uzọ ọchichọ-obi-gi.

15 N’ihi na eleghi anya ọ bu n’ihi nka ka ekewapuru ya n’ebe i nọ nwa oge ntà, ka i we nwe ya ebighi-ebi;

16 ọ dighi kwa ka orù ọzọ, kama ọ kariri orù, ọ di ka nwa-nna ahuru n’anya, nke kachasinu n’ebe m’nọ, ma nke kariri nke ahu nke-uku n’ebe i nọ, nime anu-aru na nime Onye-nwe-ayi kwa.

17 Ya mere ọ buru na i gurum n’onye-nnwekọ, nara ya nke-ọma dika mu onwem.

18 Ma ọ buru na o mejọrọ gi n’uzọ ọ bula, ma-ọbu na o ji gi ugwọ ọ bula, gua ya n’ugwọ m’ji gi;

19 Mu onwem, bú Pọl, were aka nkem de ya n’akwukwọ a, mu onwem gākwughachi ya: ka m’ghara igwa gi na ọ bu kwa onwe-gi ka i jim n’ugwọ tukwasi ihe ọzọ.

20 E, nwa-nnam, kwe ka mu onwem nwe obi-utọ n’aru gi nime Onye-nwe-ayi: me ka obim zuru ike nime Kraist.

21 Ebe m’tukwasiworo obi n’iṅa-nti-gi anamedegara gi akwukwọ, n’ihi na amataram na i gēme ọbuná kari ihe m’nēkwu.

22 Ma ọzọ kwa, dozi-kwa-ram ebe m’gānọ dika ọbìa: n’ihi na anamele anya na agēwerem nye unu n’amara site n’ekpere-unu.

23 Epafras, onye adọkọro mu na ya n’agha nime Kraist Jisus, nēkele gi;

24 ọ bu kwa otú a Mak na Aristakọs na Dimas na Luk, bú ndi mu na ha nālukọ ọlu, nēkele unu.

25 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere mọ-unu. Amen.

Categories
NDI-HIBRU

NDI-HIBRU 1

1 Chineke, mb͕e Ọ gwarari nna-ayi-hà okwu n’oge ochie nime ndi-amuma n’iberibe-akwukwọ di iche iche na uzọ di iche iche,

2 Ọ gwara ayi okwu n’ọgwugwu ubọchi ndia nime Ọkpara, Onye O doro onye-nketa nke ihe nile, Onye O site-kwa-ra n’aka-Ya me uwa nile;

3 Onye, ebe Ọ bu nnwupu nke ebube-Ya na onyinyo nke udi-Ya, ebe O nēbu kwa ihe nile site n’okwu nke ike-Ya, mb͕e Ọ sachasiri nmehie nile ayi, O we nọdu n’aka-nri nke Idi-uku ahu di n’elu;

4 ebe emere Ya-ri ka Ọ ka ndi-mọ-ozi nma n’uzọ ra otú O ketawa aha nke ka nma.

5 N’ihi na ọ̀ bu onye n’etiti ndi-mọ-ozi ka Ọ siri mb͕e ọ bula,

Ọkparam ka Gi onwe-gi bu,

Mu onwem amuwo Gi ta?

ọzọ kwa,

Mu onwem gāburu Ya Nna,

Ya onwe-ya gābu-kwa-ram Ọkpara?

6 Ma ọzọ kwa, mb͕e ọ bula Ọ gākpọbatawori Ọkpara ahu n’elu-uwa ebe madu bi, Ọ si, Ka ndi-mọ-ozi nile nke Chineke kpọ kwa isi ala nye Ya.

7 Ọ nēkwu kwa ihe bayere ndi-mọ-ozi, si,

Onye nēme ndi-mọ-ozi-Ya ka ha buru ifufe,

Nēme kwa ndi nējere Ya ozi ka ha buru ọku nēnwu enwu:

8 ma Ọ nēkwu ihe bayere Ọkpara ahu, si,

Oche-eze-gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi;

Nkpa-n’aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n’aka nke ala-eze-Gi bu kwa.

9 I huru ezi omume n’anya, we kpọ nmebi-iwu asì;

N’ihi nka Chineke, bú Chineke-Gi, tere Gi

Manu obi-utọ n’isi kari ndi-nketa-ibe-Gi.

10 Ọzọ kwa,

Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, na mbu ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa;

Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa:

11 Ha onwe-ha gāla n’iyì; ma Gi onwe-gi nānọgide:

Ha nile gāka kwa nká dika uwe;

12 Dika ákwà-nb͕okwasi ka I gāpiakọta kwa ha,

Dika uwe, agāb͕anwe kwa ha:

Ma Gi onwe-gi bu Onye ahu Nke nādi mb͕e nile,

Arọ-Gi nile agaghi-agwu kwa agwu.

13 Ma ọ̀ bu onye n’etiti ndi-mọ-ozi ka O kwuworo okwu bayere ya mb͕e ọ bula, si,

Nọdu ala n’aka-nrim,

Rue mb͕e M’gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi ukwu-Gi abua?

14 Hà nile abughi ndi-mọ nēfè òfùfè, ndi eziputara ije ozi n’ihi ndi gaje iketa nzọputa?

Categories
NDI-HIBRU

NDI-HIBRU 2

1 N’ihi nka ayi aghaghi iṅabiga nti ókè kari n’ihe anuru, ka aghara ibupu ayi n’ebe ha di ma eleghi anya, dika miri nēbupu ub͕ọ.

2 N’ihi na asi na emere okwu ekwuru site n’ọnu ndi-mọ-ozi ka o guzosie ike, asi kwa na njehie nile ọ bula na aṅaghi-nti nile ọ bula natara nnyeghachi nke ugwọ-ọlu ziri ezi;

3 àyi onwe-ayi gēsi aṅa b͕anari, ma ọ buru na ayi leghara oké nzọputa di otú a anya? bú nzọputa nke eburu uzọ kwu site n’ọnu Onye-nwe-ayi, ndi nuru ya we me ka o guzosie ike rue ebe ayi nọ;

4 Chineke nēso kwa ha nāb͕akọ àmà, site n’ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche, site kwa n’ọlu ike di iche iche, site kwa n’òkìkè nke Mọ Nsọ, dika ọchichọ nke aka Ya si di.

5 N’ihi na ọ bughi n’okpuru ndi-mọ-ozi ka O doro elu-uwa dum madu bi nke gaje ibia, bú nke ayi nēkwu okwu bayere ya.

6 Ma otù onye kwusiri ike n’otù ebe, si,

Gini ka madu bu, na I nēcheta ya?

Ma-ọbu nwa nke madu, na I nēleta ya?

7 I mere ya ka ọ di kari ndi-mọ-ozi ala nke-ntà;

I ji ebube na nsọpuru kpube ya n’isi dika okpu-eze,

I do-kwa-ra ya onye-isi ọlu nile nke aka-Gi abua:

8 Ihe nile ka I doro n’okpuru ukwu-ya abua.

N’ihi na na n’ido, ihe nile ahu n’okpuru ya, ọ dighi ihe ọ bula Ọ rapuru nke anēdoghi n’okpuru ya. Ma ub͕u a ayi akāhughi ihe nile ahu na edowo ha n’okpuru ya.

9 Ma Onye ahu Nke emere Ya ka ọ di kari ndi-mọ-ozi ala nke-ntà, bú Jisus, Ya ka ayi nēle anya, na ejiwo ebube na nsọpuru kpube Ya n’isi dika okpu-eze n’ihi ahuhu nke ọnwu, ka O we site n’amara Chineke detu ọnwu ire n’ihi madu nile ọ bula.

10 N’ihi na o kwesiri Ya, bú Onye ihe nile di n’ihi Ya, Onye ihe nile site-kwa-ra n’aka-Ya di, ebe O kubatarari ọtutu umu-ndikom n’ebube, ka O site n’ahuhu me ka Onye nēdubà ha na nzọputa-ha zue okè.

11 N’ihi na ma Onye nēdo ha nsọ ma ndi anēdo nsọ, ha nile sitere n’otù Nna: ọ bu kwa n’ihi ihe a ka ihere ikpọ ha umu-nna-Ya adighi-eme Ya,

12 Ọ si,

Agamakọrọ umu-nnem aha-Gi,

N’etiti nzukọ-Gi k m’gābù abu nye Gi.

13 Ọzọ kwa, Mu onwem ganātukwasi obim na Ya. Ọzọ kwa, Le, Mu onwem na umu-ntakiri Chineke nyerem.

14 Ya mere ebe umu-ntakiri ahu bu ndi nēnwekọ anu-aru na ọbara, Ya onwe-ya n’otù uzọ ahu keta-kwa-ra ihe ndia; ka O we site n’ọnwu me ka onye ahu ghara idi irè, bú onye nwere ike nke ọnwu, ya bu ekwensu;

15 ka O we site kwa n’ọnwu naputa ndi ahu, ka ha ra, bú ndi ewere egwu ọnwu tinye n’ibu-orù n’ogologo ndù-ha nile.

16 N’ihi na ọ bu ihe amara nke-ọma na ọ bughi ndi-mọ-ozi ka Ọ nējide aka, kama Ọ nējide nkpuru Abraham aka.

17 O sitere na ya ji ugwọ ka eme ka O yie umu-nna-Ya n’ihe nile, ka O we ghọ onye-isi-nchu-àjà di ebere, Onye kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi, n’ihe nile diri Chineke, ka O we me ka obi Chineke juru n’ebe nmehie nile nke ndi nke Ya di.

18 N’ihi na ebe Ya onwe-ya huworo ahuhu site n’ọnwunwa anwara Ya, Ọ puru iyere ndi anānwa aka.

Categories
NDI-HIBRU

NDI-HIBRU 3

1 Ya mere, umu-nnam di nsọ, ndi nketa nke ọkpukpọ nke elu-igwe, tugharinu uche n’Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà nke nkwuputa-ayi, bú Jisus;

2 na ọbu onye kwesiri ntukwasi-obi n’ebe Onye ahu nọ, bú Onye mere Ya ka Ọ buru Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà, dika Moses di kwa n’èzi-na-ulo-Ya dum.

3 N’ihi na aguwo Onye a n’Onye kwesiri otuto kari Moses, n’uzọ na otú ahu onye luru èzi-na-ulo nwere nsọpuru kari èzi-na-ulo-ya.

4 N’ihi na èzi-na-ulo ọ bula nwere onye luru ya; ma Onye luru ihe nile bu Chineke.

5 Ọ bu kwa ezie na Moses kwesiri ntukwasi-obi n’èzi-na-ulo-Ya dum dika onye nēje ozi, ka ọ buru ihe-àmà nke ihe nile agaje ikwu;

6 ma Kraist kwesiri ntukwasi-obi dika Ọkpara, Nke bu onye-isi n’èzi-na-ulo-Ya; Onye ayi onwe-ayi bu èzi-na-ulo-Ya, ma ọ buru na ayi jidesie nkwuwa-okwu-ayi na inya-isi nke olile-anya-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile.

7 N’ihi nka, dika Mọ Nsọ nāsi,

Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya,

8 Unu emela ka obi-unu sie ike, dika n’ikpasu-obi-ilu ahu,

Dika emere n’ubọchi ọnwunwa ahu n’ọhia,

9 Ebe nna-unu-hà nwaram na nnwaputa ikem,

Hu kwa ọlum ọgu arọ abua.

10 N’ihi nka ọnuma dim n’obi megide ọb͕ọ a,

M’we si, Ha nējehie mb͕e nile n’obi-ha:

Ma ndi ahu amaghi uzọm nile;

11 Dika M’ṅuru iyí n’iwe m si,

Ha agaghi-abà n’izu-ikem ma-ọli.

12 Lezienu anya, umu-nnam, ka ajọ obi nke ekweghi-ekwe ghara idi nime onye ọ bula n’etiti unu ma eleghi anya, n’iwezuga onwe-ya n’ebe Chineke di ndu nọ:

13 kama nāriọritanu ibe-unu aririọ kwa-ubọchi, n’ogologo oge a anākpọ ya Ta; ka obi onye ọ bula n’etiti unu ghara ime etili site n’aghughọ nke nmehie:

14 n’ihi na ayi aghọwo ndi nketa nke Kraist, ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi jidesiri nmalite nke ndabere-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile:

15 n’oge anēkwu, si,

Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya,

Unu emela ka obi-unu sie ike, dika n’ikpasu-obi-ilu ahu.

16 N’ihi na òle ndi, mb͕e ha nuru, kpasuru obi-ilu? ọ̀ bughi kwa ndi nile ndi siri n’Ijipt puta site n’aka Moses?

17 Ma òle ndi ka ọnuma di Ya n’obi megide ọgu arọ abua? ọ̀ bughi ndi mehiere, ndi ozu-ha dara nime ọhia?

18 Ma òle ndi ka Ọ ṅuru iyi na ha agaghi-abà n’izu-ike-Ya, ma ọ bughi ndi nēkweyeghi?

19 Ayi riba-kwa-ra ama na ha apughi ibà nime n’ihi ekweghi-ekwe.

Categories
NDI-HIBRU

NDI-HIBRU 4

1 Ya mere ka ayi tua egwui ma, ebe nkwa ibà n’izu-ike-Ya fọduru, ọ di onye ọ bula n’etiti unu ọ gādi ka o rughi ya ma eleghi anya.

2 N’ihi na eziwo kwa ayi ozi ọma, ọbuná dika ezi-kwa-ra ha: ma okwu nke ha nuru abaraghi ha urù, n’ihi na ejighi okwukwe tunyere ha na ndi nuru n’ezie.

3 N’ihi na ayi, bú ndi kwere ekwe, nābà n’izu-ike ahu; dika O kwuworo, si,

Dika M’ṅuru iyi n’iwem,

Ha agaghi-abà n’izu-ikem ma-ọli:

ọ bu ezie na alusiri ọlu nile site na ntọ-ala nke uwa.

4 N’ihi na O kwuwo n’otù ebe okwu bayere ubọchi nke-asa otú a, si, Chineke we zuru ike n’ubọchi nke-asa n’ọlu-Ya nile;

5 ọzọ, Ọ si kwa n’ebe a,

Ha agaghi-abà n’izu-ikem ma-ọli.

6 Ya mere ebe ọ foduru ka ufọdu ba nime ya, ndi eburu uzọ zie ozi ọma abàghi kwa nime ya n’ihi ekweyeghi-ekwenye,

7 O we kà otù ubọchi ọzọ, nēkwu nime Devid, mb͕e ogologo oge di otú a gasiri, si, Ta, dika ebuworo uzọ kwue, si,

Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya,

Unu emela ka obi-unu sie ike.

8 N’ihi na asi na Joshua mereri ka ha zuru ike, Ọ gaghi-adi nēkwu okwu bayere ubọchi ọzọ mb͕e ihe ndia gasiri.

9 Ya mere idebe-ubọchi-izu-ike fọduru ndi nke Chineke.

10 N’ihi na onye bataworo n’izu-ike-ya, ya onwe-ya ezuwo kwa ike n’ọlu-ya nile, dika Chineke zuru ike n’ọlu nke aka Ya.

11 Ya mere ka ayi nānu ọku n’obi ibà n’izu-ike ahu, ka onye ọ bula ghara ida n’otù ihe-nṅomi ahu nke ekweyeghi-ekweye.

12 N’ihi na okwu Chineke di ndu, nālusi kwa ọlu ike, di kwa nkọ kari mma-agha ọ bula nke nwere iru abua, nādu kwa rue n’ikewa nkpuru-obi na mọ, ma njikọta ma umi, buru kwa ihe nwere ike ituputa èchichè na izù nile nke obi.

13 Ọ dighi kwa ihe ekère èkè nke nāputaghi ihè n’iru Ya: kama ihe nile b͕a ọtọ buru kwa ihe emegheworo n’anya-Ya, bú Onye ayi gākọrọ akukọ bayere omume-ayi.

14 Ya mere ebe ayi nwere Onye-isi-nchu-àjà di uku, Onye gabigaworo eluigwe nile, bú Jisus Ọkpara Chineke, ka ayi jidesie nkwuputa-ayi ike.

15 N’ihi na ayi enweghi onye-isi-nchu-àjà onye nāpughi iji obi so ayi hukọ ahuhu n’adighi-ike-ayi; kama ayi nwere Onye anwaworo n’ihe nile n’otù uzọ ahu anānwa ayi, ma O mehieghi.

16 Ya mere ka ayi were nkwuwa-okwu biarue oche-eze amara, ka ewe mere ayi ebere, ka ayi we hu kwa amara iyere ayi aka n’oge nkpà.

Categories
NDI-HIBRU

NDI-HIBRU 5

1 N’ihi na onye-isi-nchu-àjà ọ bula, esi n’etiti madu weputa ya, ọ bu n’ihi madu ka anēdo ya onye-isi-nchu-àjà n’ihe diri Chineke, ka o we nēche onyinye na àjà di iche iche n’ihi nmehie n’iru Chineke:

2 ọ bu kwa onye puru iwere nwayọ nēmeso ndi nāmaghi ihe ndi nējehie kwa ejehie, n’ihi na adighi-ike di kwa ya onwe-ya gburugburu;

3 n’ihi nka o ji kwa ugwọ iche àjà n’iru Chineke n’ihi nmehie, dika ọ nēchere ndi Israel, otú ahu ọ nēche-kwa-ra onwe-ya.

4 Ọ dighi kwa onye ọ bula nānara nsọpuru a n’onwe-ya, kama mb͕e Chineke nākpọ ya, ọbuná dika Ọ kpọ-kwa-ra Eron.

5 Otú a Kraist enyeghi kwa Onwe-ya otuto ka ewe me Ya onye-isi-nchu-àjà, kama ọ bu Onye siri Ya,

Ọkparam ka Gi onwe-gi bu,

Mu onwem amuwo Gi ta:

6 dika O si kwu kwa n’ebe di iche, si,

Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi

Dika usoro Melkizedek si di.

7 Onye n’ubọchi nke anu-aru-Ya, mb͕e Ọ weresiri ikwa-ákwá siri ike na anya-miri che ekpere na aririọ n’iru Onye ahu puru izọputa Ya n’ọnwu, mb͕e anusi-kwa-ra olu-Ya n’ihi na Ọ turu egwu Chineke,

8 ọ bu ezie na Ọ bu Ọkpara, ma Ọ mutara iṅa-nti-Ya site n’ahuhu nile Ọ huru;

9 ebe emesiri Ya ka O zue okè, O we ghọrọ ndi nile nāṅa Ya nti Onye nēwetara ha nzọputa ebighi-ebi;

10 Onye Chineke nyere aha onye-isi-nchu-àjà dika usoro Melkizedek si di.

11 Onye okwu ayi nwere ikwu bayere ya di uku, di kwa ike isughari asusu, ebe unu ghọworo ndi nwere nti ike.

12 N’ihi na mb͕e unu kwesiri ibu ndi-ozizí n’ihi oge, ọ di unu nkpà ọzọ ka madu zí unu ihe bu ihe-ozizí mbu nke nmalite okwu si n’ọnu Chineke puta; unu aghọwo kwa ndi miri-ara di nkpà, ọ bughi nri siri ike.

13 N’ihi na onye ọ bula nke nēketa miri-ara bu onye akānwaghi ya n’okwu ezi omume; n’ihi na ọ bu nwa ọhu.

14 Ma nri siri ike bu nke ndi tozuru okè, ndi anwaworo nghọta-ha n’ihi omume ha nēme mb͕e dum itule ihe ọma na ihe ọjọ.

Categories
NDI-HIBRU

NDI-HIBRU 6

1 N’ihi nka ka ayi rapu okwu nke nmalite nke Kraist, ka anēburu kwa ayi rue n’itozu-okè; ka ayi ghara itọ ntọ-ala ọzọ nke bu nchèghari iji pua n’ọlu nile nwuru anwu, na okwukwe ekwere na Chineke,

2 ozizí nke ime-baptism, na nke ibikwasi-aka-n’isi, na nke nbilite-n’ọnwu nke ndi nwuru anwu, na nke ikpé ebighi-ebi.

3 Nka ka ayi gēme kwa, ma ọ buru na Chineke kwe.

4 N’ihi na ndi enyere ìhè otù mb͕e, ndi detu-kwa-ra onyinye elu-igwe ahu ire, ndi eme-kwa-ra ka ha keta Mọ Nsọ,

5 ndi detu-kwa-ra okwu Chineke ire hu ọ di nma, detu kwa ike nile nke oge gaje ibia ire,

6 ha we dahie, ọ bu ihe anāpughi ime bu ime ka ha buru ndi ọhu ọzọ ichèghari echèghari; ebe ha nākpọgidere onwe-ha Ọkpara Chineke n’obe ọzọ, debe kwa Ya n’ọnọdu-ihere n’iru ọra madu.

7 N’ihi na ala nke ṅuworo miri-ozuzo nke nēzokwasi ya ọtutu mb͕e, nke nēpuputa kwa nkpa-akwukwọ kwesiri ndi ahu, bú ndi anālu kwa ya ọlu n’ihi ha, ala ahu nēkère ngọzi si n’aka Chineke bia:

8 ma ọ buru na ọ nēweputa ogwu na uke, ọ bu ihe ajuru aju, di kwa ọbubu-ọnu nso; nke ọgwugwu-ya bu ire ya ọku.

9 Ma, ndi m’huru n’anya, emewo ka ayi kwere ihe ka nma bayere unu, bú ihe nke ha na nzọputa yikọ kwa, ọ bu ezie na ayi nēkwu otú a:

10 n’ihi na Chineke abughi onye ajọ omume ichezọ ọlu-unu na ihu-n’anya ahu unu gosiri n’ebe aha-Ya di, ebe unu jere ndi nsọ ozi, nēje-kwa-ra ha ozi.

11 Ma ọ nāgu ayi agu ka unu nile n’otù n’otù we nēgosi otù inu-ọku-n’obi ahu ka unu we nwezue olile-anya-ayi rue ọgwugwu ihe nile:

12 ka unu we ghara ighọ ndi ume-ngwu, kama ka unu we buru ndi nēṅomi ndi ahu ndi ji okwukwe na ogologo-ntachi-obi nēketa nkwa ahu.

13 N’ihi na mb͕e Chineke kwere Abraham nkwa, ebe Ọ nēnweghi onye ọ bula ka Ya uku iji ṅu iyí, O ji Onwe-ya ṅu iyí,

14 si, Me-elu-me-ala n’igọzi M’gāgọzi gi, n’ime ka aba uba M’gēme ka i ba uba.

15 Otú a o we nwe ogologo-ntachi-obi, we nata kwa nkwa ahu.

16 N’ihi na madu ji onye ka ha uku aṅu iyi: iṅu-iyi bu-kwa-ra ha nkwubì-okwu nke okwu ọ bula, ime ka o guzosie ike.

17 N’otù uzọ ahu Chineke, ebe Ọ nēzube igosibiga ndi-nketa nke nkwa-Ya ókè kari na izù-Ya bu ihe nādighi-agha agha, O were iṅu-iyí b͕o okwu:

18 ka ayi we were ihe abua nādighi-agha, nke Chineke nāpughi ikwu okwu-ugha nime ha, nwe nkasi-obi siri ike, ayi, bú ndi b͕abàra ijidesi olile-anya ahu ike, bú nke edebere n’iru ayi;

19 bú olile-anya nke ayi nwere dika ihe njiko nke nkpuru-obi, nke bu ihe-ntukwasi-obi na ihe nēguzosi ike, nke nābà kwa nime ebe ahu nke di nime ákwà-nb͕ochi;

20 n’ebe Jisus batara n’ihi ayi dika onye nēbu uzọ b͕a ọsọ, ebe emere Ya ka Ọ buru onye-isi-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi dika usoro nke Melkizedek si di.

Categories
NDI-HIBRU

NDI-HIBRU 7

1 N’ihi na Melkizedek nka, eze Selem, onye-nchu-àjà nke Chineke Onye kachasi ihe nile elu, onye zutere Abraham mb͕e o si n’ob͕ub͕u ndi-eze ahu laghachi, we gọzie ya,

2 onye Abraham kè-kwa-ra otù uzọ n’uzọ iri n’ihe nile nye, (ebe ọ bu mbu, ma asugharia aha-ya, Eze nke ezi omume, buru kwa ma emesia Eze nke Selem, nke bu, Eze nke udo;

3 enweghi nna, enweghi nne, enweghi akukọ osuso-ọmumu, enweghi nmalite ubọchi ma-ọbu ọgwugwu ndu, ma emewo ya ka o yie Ọkpara Chineke), ọ nānọgide onye-nchu-àjà mb͕e nile.

4 Ma lenu otú onye a di uku, onye Abraham, bú nna-ayi mbu, nyere otù uzọ n’uzọ iri n’isi ihe alutara n’agha.

5 Ọ bu kwa ezie na ndi ahu ndi si n’etiti umu Livai puta ndi nānara ọlu onye-nchu-àjà nwere ihe enyere n’iwu inara ndi Israel otù uzọ n’uzọ iri dika iwu-ha si di, nke ahu bu, inara umu-nne-ha, ọ bu ezie na ha esiwo n’afọ Abraham puta:

6 ma onye ahu nke anēsiteghi na ha gu akukọ osuso-ọmumu-ya anarawo Abraham otù uzọ n’uzọ iri, gọzi kwa onye nwere nkwa ndia.

7 Ma apughi ikwugide nka okwu ọ bula na onye ka nma nāgọzi onye dikariri ntà.

8 Ọzọ, n’ebe a madu ndi nānwu anwu nānata otù uzọ n’uzọ iri; ma n’ebe ahu otù onye nānata ha, nke anāb͕ara ya àmà na ọ di ndu.

9 Agēkwu otú a, na ọbuná Livai, onye nānata otù uzọ n’uzọ iri, na o site-kwa-ra n’aka Abraham nye otù uzọ n’uzọ iri;

10 n’ihi na ọ nānọ n’aha nna-ya n’oge ahu, mb͕e Melkizedek zutere ya.

11 Ya mere ọ buru na ewere ọnọdu ndi-nchu-àjà ndi Livai me ka madu zue okè (n’ihi na ndi Israel anatawo iwu n’okpuru ya), nkpà gini ọzọ di ka onye-nchu-àjà di iche bilie dika usoro Melkizedek si di, ka aghara kwa igu ya dika usoro Eron si di?

12 N’ihi na ebe enyeworo ọnọdu ndi-nchu-àjà ahu, ọ di nkpà ka ọdida nke iwu puta kwa.

13 N’ihi na Onye ahu anēkwu ihe ndia bayere Ya eketawo òkè n’ebo di iche, nke ọ dighi onye ọ bula nyeworo aka n’ebe-ichu-àjà site na ya.

14 N’ihi na ọ putawo ìhè na Onye-nwe-ayi esiwo na Juda rọputa; bú ebo nke Moses nēkwughi ihe ọ bula bayere ndi-nchu-àjà nye ya.

15 Ihe ayi nēkwu aputabigawo kwa ìhè ókè nke-uku kari, ma ọ buru na Onye-nchu-àjà di iche ebilie dika oyiyi Melkizedek si di,

16 Onye emeworo Ya ka Ọ buru onye-nchu-àjà, ọ bughi dika iwu nke ihe enyere n’iwu nye anu-aru si di, kama dika ike nke ndu nādighi-agwu agwu si di:

17 n’ihi na anāb͕ara Ya àmà, si,

Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi

Dika usoro Melkizedek si di.

18 N’ihi na emere ka ihe eburu uzọ nye n’iwu ghara idi irè n’ihi adighi-ike-ya na abaghi-urù-ya,

19 (n’ihi na iwu ahu emeghi ihe ọ bula ka o zue okè), ewe webata olile-anya ka nma, nke ayi ji biaru Chineke nso.

20 Otú ọ dighi kwa ma ejighi iṅu-iyi,

21 (n’ihi na ọ bu ezie na emewo ha ka ha buru ndi-nchu-àjà nāṅughi iyi; ma emewo Ya onye-ya n’iṅu iyi site n’aka Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Ya, si,

Onye-nwe-ayi ṅuru iyi, Ọ gaghi-echèghari kwa uche-Ya,

Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi);

22 ọ bu kwa n’uzọ ra otú a ka emeworo Jisus ka Ọ buru onye-ala ebe nke ọb͕ub͕a-ndu ka nma.

23 Ọ bu kwa ezie na emewo ndi ahu ka ha buru ndi-nchu-àjà riri nne, n’ihi na ọnwu nēb͕ochi ha inọgide:

24 ma Ya onwe-ya, n’ihi na Ọ nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi, O nwere ọnọdu-onye-nchu-àjà-Ya nādighi-agabiga onye ọzọ.

25 O site-kwa-ra na nka pu izọputachasi ndi nēsite n’aka Ya abiakute Chineke, ebe Ọ nādi ndu mb͕e nile iriọ aririọ n’ihi ha.

26 N’ihi na onye-isi-nchu-àjà di otú a kwesiri ayi, Onye di ọcha n’obi, Onye nēnweghi obi ọjọ, Onye anēmerughi emeru, Onye ekewapuworo n’etiti ndi-nmehie, me kwa Ya ka Ọ di elu kari elu-igwe nile;

27 Onye ọ nādighi Ya nkpà kwa-ubọchi, dika ndi-isi-nchu-àjà ahu, ichu àjà di iche iche, mbu n’ihi nmehie nile nke aka ya, emesia n’ihi nmehie nile nke ndi Israel: n’ihi na nka ka O mere nání otù mb͕e, mb͕e Ọ churu Onwe-ya dika àjà.

28 N’ihi na iwu nēdo madu ndi-isi-nchu-àjà, ndi nādighi ike; ma okwu nke iṅu-iyi ahu, nke soro iwu ahu n’azu, nēdo Ọkpara, Onye emeworo Ya ka O zue okè rue mb͕e ebighi-ebi.