Categories
NDI EFESỌS

NDI EFESỌS 4

1 Ya mere mu onwem, bú onye-nkpọrọ nime Onye-nwe-ayi, nāriọ unu ka unu jegharia dika o kwesiri ọkpukpọ nke akpọrọ unu,

2 n’obi di ume-ala na idi-nwayọ nile, n’ogologo ntachi-obi, nānagiderita ibe-unu nime ihu-n’anya;

3 nānu ọku n’obi idebe idi-n’otù nke Mọ Nsọ nime ihe-ọkiké nke bu udo.

4 Otù aru di, otù Mọ di kwa, dika akpọ-kwa-ra unu nime otù olile-anya nke ọkpukpọ-unu;

5 otù Onye-nwe-ayi di, otù okwukwe di, otù baptism di,

6 otù Chineke na Nna nke ayi nile di, Onye bu isi ayi nile, Onye site-kwa-ra n’aka ayi nile nālu ọlu, Onye nānọ kwa nime ayi nile.

7 Ma ọ bu ayi nile n’otù n’otù ka enyere amara ahu dika ọtùtù nke onyinye Kraist si di.

8 N’ihi nka Ọ si,

Mb͕e Ọ rigoro n’elu, Ọ dọtara usu ndi adọtara n’agha n’agha,

Nye kwa madu onyinye di iche iche.

9 (Ma okwu nka, Ọ rigoro, gini ka ọ bu ma-ọbughi na Ọ rida-kwa-ra nime akuku uwa dikariri ala?

10 Onye ridara bu kwa Onye ahu Nke rigoro n’ebe kachasi elu-igwe nile elu nke-uku, ka O we mezu ihe nile.)

11 Ya onwe-ya nye-kwa-ra ufọdu ka ha buru ndi-ozi; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi-amuma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nēzisa ozi ọma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nāzù aturu Chineke na ndi-ozizí;

12 ime ka ndi nsọ zu okè ilu ọlu nke ije-ozi, iwuli aru nke Kraist elu dika ulo:

13 rue mb͕e ayi nile gēru idi-n’otù nke okwukwe na nke nmazu nke Ọkpara Chineke, ru ibu nwoke tozuru okè, ru ọtùtù nke ogologo nke ozuzù nke Kraist:

14 ka ayi we ghara ibu umu ọhu ọzọ, ndi ifufe nile ọ bula nke ozizí nēfeghari nēbughari kwa, nime itu-ntu nke madu, nime aghughọ, nke ha ji ezuputa nduhie;

15 kama ka ayi we nēso ezi-okwu nime ihu-n’anya, we tó etó rue nime Ya n’ihe nile, Onye bu isi-ayi, bú Kraist;

16 Onye aru nile, ebe anēwere nkwonkwo nile ọ bula nke nnyezu kwukọ ya nke-ọma jikọ kwa ya, dika ilusi-ọ1u-ike nke akuku nile ọ bula n’otù n’otù n’ọtùtù-ha si di, aru nile ahu nēsite na Ya nēme ka aru ba uba iwuli onwe-ya elu dika ulo nime ihu-n’anya.

17 Ya mere nka ka m’nēkwu, kwusi kwa ike nime Onye-nwe-ayi, ka unu ghara ijeghari ọzọ dika ndi mba ọzọ nējeghari kwa, n’ihe-efu nke uche-ha,

18 n’ihi na emewo ka ha b͕a ọchichiri n’èchìchè-uche-ha, eme kwa ka ha buru ndi ala ọzọ n’ebe ndu nke Chineke di n’ihi amaghi-ihe di nime ha, n’ihi na anēme ka obi-ha me etili;

19 madu ndi, ebe nmehie-ha nādighi-ewuta ha ọzọ, ha rara onwe-ha nye n’aka agu ikwa-iko, iluputa adighi-ọcha nile nime anya-uku.

20 Ma unu onwe-unu amutaghi Kraist-ayi otú a;

21 asi na ọ bu ezie na ọ bu Ya onwe-ya ka unu nuru, asi kwa na ọ bu nime Ya ka ezíri unu ihe, dika ezi-okwu di nime Jisus:

22 ka unu tupu madu ochie unu, nke nēmebi emebi n’uzọ agu nke aghughọ, dika ibi-obi-unu na mbu si di;

23 ka eme kwa ka unu di ọhu na mọ nke uche-unu,

24 ka unu yikwasi kwa madu ọhu unu, nke ekère dika Chineke chọrọ nime ezi omume na idi-ọcha nke ezi-okwu ahu.

25 N’ihi nka, ebe unu tupuru okwu-ugha, nēkwunu ezi-okwu onye ọ bula n’ebe onye-ab͕ata-obi-ya nọ: n’ihi na ayi nāburita ihe di n’aru ibe-ayi.

26 Unu emehiela mb͕e unu nēwe iwe: ekwela anyanwu da na nkpasu-iwe-unu:

27 enye-kwa-la ekwensu uzọ.

28 Ka onye nēzu ori ghara izu kwa ori ọzọ: kama ka ọ dọb͕u onwe-ya n’ọlu, nēji aka ya abua lu ezi ihe, ka o we nwe ihe ya na onye nọ na nkpà gēketa.

29 Ka okwu ọ bula nke ruru aru ghara isi n’ọnu-unu puta, kama ihe bu ezi ihe, iwuli madu elu dika ulo, dika nkpà si di, ka o we nye ndi nānu ya amara.

30 Unu eme-kwa-la ihe gēwuta Mọ Nsọ nke Chineke, Onye akara unu akàrà nime Ya rue ubọchi nb͕aputa.

31 Ka ewepu ihe-ilu na ọnuma na iwe na iti-nkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọ nile, n’etiti unu:

32 nweritanu obiọma n’aru ibe-unu, nwenu obi ọmiko, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, dika Chineke were-kwa-ra amara b͕aghara unu nime Kraist.

Categories
NDI EFESỌS

NDI EFESỌS 5

1 Ya mere burunu ndi nēṅomi Chineke. dika umu ahuru n’anya;

2 nējeghari-kwa-nu n’ihu-n’anya, dika Kraist-ayi hu-kwa-ra unu n’anya, rara kwa Onwe-ya nye n’ihi ayi, dika ihe echere n’iru Chineke na àjà achuru nye Ya ka ọ buru isisì nke ihe ísì utọ.

3 Ma ikwa-iko, na adighi-ọcha nile, ma-ọbu anya-uku, ka aghara ikpọ ọbuná aha-ya n’etiti unu, dika o kwesiri ndi nsọ;

4 ma-ọbu ihe-ihere, ma-ọbu ikwu-okwu-nzuzu, ma-ọbu okwu nābaghi n’ihe, nke nēkwesigh: ma kama nke ahu ikele-ekele.

5 N’ihi na nka ka unu matara nke-ọma, na ọ dighi onye ọ bula nke bu onye nākwa iko, ma ọbu onye n-adighi ọcha, ma-ọbu onye-anya-ukwu, nke isi-ya bu onye nēkpere arusi, nwere ihe-nketa n’ala-eze nke Kraist na Chineke.

6 Unu ekwela ka onye ọ bula were okwu efu rafue unu: n’ihi na ọ bu n’ihi ihe ndia ka iwe Chineke nābiakwasi umu nke ekwenyeghi-ekwenye.

7 Ya mere, unu esola ha kekọ ihe;

8 n’ihi na unu buri ọchichiri n’oge gara aga, ma unu bu ìhè ub͕u a nime Onye-nwe-ayi: nējegharinu dika umu nke ìhè

9 (n’ihi na nkpuru nke ìhè ahu di n’idi-nma na ezi omume na eziokwu nile),

10 nānwaputa ihe di Onye-nwe-ayi ezi mma;

11 unu esola ọlu nke ọchichiri nke nāmighi nkpuru nēnwekọ ihe, ma kama nke ahu nātu-kwa-nu ha nmehie-ha n’anya;

12 n’ihi na ọ bu ihe-ihere ọbuná ikwu okwu bayere ihe nile ha nēme na nzuzo.

13 Ma ìhè nēme ka ihe nile puta ìhè mb͕e anātu ha nmehie-ha n’anya: n’ihi na ihe ọ bula anēme ka ọ puta ìhè bu ìhè.

14 N’ihi nka Ọ si, Teta, gi onye nāraru ura, Si kwa na ndi nwuru anwu bilie, Kraist ahu gāmukwasi kwa gi.

15 Ya mere lezienu anya nke-ọma otú unu nējeghari, ọ dighi ka ndi nāmaghi ihe, kama dika ndi mara ihe;

16 nāzuchapuru onwe-unu oge a nile, n’ihi na ubọchi ndia jọrọ njọ.

17 N’ihi nka unu aghọla ndi nēnweghi uche, kama ghọtanu ihe bu ihe Onye-nwe-ayi nāchọ.

18 Unu aṅubiga-kwa-la manya ókè, nke ndu ila-n’iyì di nime ya, kama juputanu na Mọ Nsọ;

19 nēwere abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ gwarita onwe-unu okwu, nēwere obi-unu bù abù kpọ kwa ubọ nye Onye-nwe-ayi;

20 nēkele kwa Chineke, bú Nna, ekele mb͕e nile n’ihi ihe nile n’aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist;

21 nēdorita onwe-unu n’okpuru ibe-unu nime egwu Kraist.

22 Ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n’okpuru di nke aka unu, dika n’okpuru Onye-nwe-ayi.

23 N’ihi na di bu isi nke nwunye, dika Kraist-ayi bu kwa isi nzukọ-Ya, ebe Ya onwe-ya bu Onye-nzọputa nke aru.

24 Ma dika anēdo nzukọ ahu n’okpuru Kraist-ayi, otú a ka ndi bu nwunye do kwa onwe-ha n’okpuru di-ha n’ihe nile ọ bula.

25 Ndi bu di, hunu nwunye-unu n’anya, dika Kraist-ayi hu-kwa-ra nzukọ-Ya n’anya, rara kwa Onwe-ya nye n’ihi ya;

26 ka O we do ya nsọ, mb͕e O mesiri ka ọ di ọcha site n’ọsisa miri n’okwu Chineke,

27 ka Ya onwe-ya we che nzukọ ahu n’iru Onwe-ya dika ihe di ebube, nēnweghi ntupọ ma-ọbu iru-ndọli ma-ọbu ihe ọ bula n’ihe di otú a; kama ka o we di nsọ buru kwa ihe anāpughi ita uta.

28 Otú a ndi bu di ji kwa ugwọ ihu nwunye nke aka ha n’anya dika ha huru aru nke onwe-ha n’anya. Onye nāhu nwunye nke aka ya n’anya nāhu onwe-ya n’anya:

29 n’ihi na ọ dighi onye ọ bula kpọrọ aru onwe-ya asì mb͕e ọ bula; kama ọ nāzù ya nēlezi kwa ya anya nke-ọma, dika Kraist nēme kwa nzukọ-Ya;

30 n’ihi na ayi bu ihe di n’aru-Ya.

31 N’ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n’aru nwunye-ya; ha abua ewe ghọ otù anu-aru.

32 Ihe-omimi a di uku: ma mu onwem nēkwu okwu bayere Kraist baye-kwa-ra nzukọ-Ya.

33 Otú ọ di, unu onwe-unu n’otù n’otù hu kwa nwunye-unu n’anya, onye ọ bula ya hu nwunye nke aka ya n’anya, dika ọ nāhu onwe-ya n’anya; ka nwunye lezi kwa anya ka ọ nātu egwu di ya.

Categories
NDI EFESỌS

NDI EFESỌS 6

1 Umu, nāṅanu nti okwu ndi muru unu nime Onye-nwe-ayi: n’ihi na nka bu ihe ziri ezi.

2 Sọpuru nna-gi na nne-gi (nke bu ihe mbu enyere n’iwu nke nkwa diri ya),

3 ka ihe we nāgara gi nke-ọma, ka i we di kwa ogologo ndu n’elu uwa.

4 Ndi bu nna, akpasu-kwa-la umu-unu iwe: kama nāzùputa ha n’ọzùzù na idu-ọdu nke Onye-nwe-ayi.

5 Ndi-orù, werenu egwu na ima-jijiji nāṅa nti okwu ndi bu ndi-nwe-unu n’uzọ anu-aru, nime afọ-ofufo nke obi-unu, dika unu nēmere Kraist;

6 ọ bughi n’uzọ ibu-orù-n’anya, dika ndi nēme otú ọ gātọ madu utọ; kama dika ndi-orù Kraist, nēme ihe Chineke nāchọ site na nkpuru-obi-unu;

7 were-kwa-nu obi-ọma nābu orù, dika ọ bu Onye-nwe-ayi ka unu bu orù-Ya, ọ bughi kwa madu:

8 ebe unu matara na ezi ihe ọ bula onye ọ bula nēme, nka ka ọ gānaghachi n’aka Onye-nwe-ayi, ma ọ bu orù ma-ọbu onye nwe onwe-ya.

9 Ndi-nwe madu, nēme-kwa-ranu ha otù ihe ahu, nārapu iba-nba-unu: ebe unu matara na Onye-nwe ma ha ma unu nọ n’elu-igwe, ile-madu-anya-n’iru adighi kwa n’ebe Ọ nọ.

10 Nke fọduru, menu onwe-unu ka unu di ike nime Onye-nwe-ayi, ya na nime idi-ike nke ike-Ya.

11 Yikwasinu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ihe nile ekwensu nēzuputa.

12 N’ihi na ib͕a-nb͕a-ayi abughi imegide anu-aru na ọbara, kama ọ bu imegide ibu-ndi-isi nile, imegide ichi-isi nile, imegide ndi-onwe-uwa nke ọchichiri a, imegide ndi-agha mọ nke ajọ ihe n’ebe di n’elu-igwe.

13 N’ihi nka chilienu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ndi-iro-unu n’ajọ ubọchi, na iguzo, ebe unu luputaworo ihe nile.

14 Ya mere guzonu, mb͕e unu weresiri ezi-okwu ke úkwù-unu, were kwa ihe-agha nke nēb͕ochi obi yikwasi, bú ezi omume,

15 were kwa nkwadebe nke bu ozi ọma nke udo yikwasi n’ukwu-unu;

16 tukwasi ihe nile ndia welienu ọta nke bu okwukwe, nke unu gāpu imenyu àkú-uta nile nēnwu ọku nke ajọ onye ahu nime ya.

17 Nara-kwa-nu okpu-agha nke bu nzọputa, ya na mma-agha nke Mọ Nsọ, nke bu okwu Chineke:

18 site-kwa-nu n’ekpere na aririọ nile nēkpe ekpere n’oge nile nime Mọ Nsọ, were kwa inọgidesi-ike na iriọ-aririọ nile bayere ndi nsọ nile nāmu anya ime nka,

19 nēkpe kwa ekpere n’ihim, ka ewe nyem okwu n’isaghe ọnum, iwere nkwuwa-okwu me ka madu mara ihe-omimi nke ozi ọma,

20 nke m’bu ukọ̀ nime nkpọrọ n’ihi ya; ka m’we kwuwa okwu nime ya, dika m’nāghaghi ikwu.

21 Ma ka unu onwe-unu we mata kwa ihe nile bayerem, otú m’nēme, Tikikọs, onye bu nwa-nna-ayi ahu ahuru n’anya, bu kwa onye kwesiri ntukwasi-obi n’ije-ozi nime Onye-nwe-ayi, ọ gēme ka unu mara ihe nile:

22 onye m’nēzigara unu ime otù ihe a, ka unu we mara otú ihe nāgara ayi, ka o we kasi kwa obi-unu.

23 Udo diri umu-nna-ayi, ya na ihu-n’anya nke ya na okwukwe yikọ, site na Chineke, bú Nna, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.

24 Ka amara diyere ndi nile huru Onye-nwe-ayi Jisus Kraist n’anya n’emebighi-emebi.

Categories
NDI FILIPAI

NDI FILIPAI 1

1 Pọl na Timọti, ndi-orù nke Kraist Jisus, nēdegara ndi nsọ nile nime Kraist Jisus ndi nọ na Filipai akwukwọ, ha na ndi nēlekọta unu anya na ndi nējere unu ozi:

2 Amara diri unu na udo nke si n’aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.

3 Anamekele Chinekem na ncheta nile m’nēcheta unu,

4 mb͕e nile n’aririọ nile m’nāriọrọ unu nile nāriọ aririọ ahu nime ọṅù,

5 n’ihi nnwekọ unu nwekọrọ n’izisa ozi ọma site n’ubọchi mbu rue ub͕u a;

6 ebe m’tukwasiworo obim n’otù ihe nka, na Onye malitere ilu ezi ọlu nime unu gāluzu ya rue ubọchi Jisus Kraist:

7 dika o ziri ezi ka m’tukwasi uchem n’ihe a bayere unu nile, n’ihi na enwerem unu n’obim, ebe unu nile bu ndi nēsom n’inwekọ amara, ma nime ab͕um ma nime ngọpu nke ozi ọma na ime ka o guzosie ike.

8 N’ihi na Chineke bu onye-àmà nkem, otú agu unu nile nāgusim ike n’obi-ebere nke Kraist Jisus.

9 Nka ka m’nēkpe kwa ekpere, ka ihu-n’anya-unu we nābabiga kwa ókè kari nke-uku nime nmazu na nghọta nile;

10 ka unu we nwa ihe ha na ibe-ha di iche; ka unu we di ọcha n’obi ghara kwa isu ngọngọ rue ubọchi nke Kraist;

11 ebe unu gābu ndi juputaworo na nkpuru nke ezi omume, nke sitere n’aka Jisus Kraist, ka Chineke we nwe ebube na otuto.

12 Ma anamezube ka unu mara, umu-nnam, na, kama ihe ọzọ, ọnọdum emewo ka ozi ọma ga n’iru;

13 ya mere ab͕um putara ìhè nime Kraist na Pritoriọm dum, ya na n’ebe ndi nile fọduru nọ;

14 o me kwa ka ndi ka n’ọnu-ọgugu n’etiti umu-nna nime Onye-nwe-ayi nwebiga anya-ike ókè ikwu okwu Chineke nātughi egwu, ebe ha tukwasiworo obi site n’ab͕um.

15 Ọ bu ezie na ufọdu nēkwusa Kraist-ayi ọbuná n’ihi ekworo na esem-okwu; ma ufọdu nēkwusa kwa Ya n’ihi na ọ di ha ezi nma:

16 ndia nēme ya site n’ihunanya, ebe ha matara na edorom ka m’we gọpu ozi ọma:

17 ma ndi ahu nēkwusa Kraist-ayi site n’ikpa-iche-iche, ọ bughi n’idi-ọcha-n’obi, ebe ha nēchè na ha gēwelirim nkpab͕u n’ab͕um.

18 Gini kwa? ọ bu nání na n’uzọ ọ bula, ma ọ bu n’aghughọ ma-ọbu n’ezi-okwu, anēkwusa Kraist; nime nka ka m’nāṅuri kwa ọṅu, e, m’gāṅuri kwa ọṅu nime ya.

19 N’ihi na amataram na nka gēme ka m’nwe nzọputa, site n’aririọ-unu na nnyezu nke Mọ nke Jisus Kraist,

20 dika olile-anya siri ike na ntukwasi-obi nkem si di, na n’ihe ọ bula ọ dighi ihere gēmem, kama na agēme kwa ka Kraist di uku n’arum ub͕u a, otú ọ di mb͕e nile, ma ọ bu site na ndu, ma-ọbu site n’ọnwu, nime nkwuwa-okwu nile.

21 N’ihi na n’ebe m’nọ idi ndu bu Kraist, inwu anwu bu kwa urù.

22 Ma ọ buru na idi ndu n’anu-aru bu òkèm, nka bu nkpuru nke ọlum: ihe m’gārọputa kwa amaghi m.

23 Ma anọm n’ebe di nkpà n’etiti ihe abua ndia, ebe agu ila na inọ n’ebe Kraist nọ nāgum; n’ihi na ọ kachasi nma nke-uku:

24 ma inọgide n’anu-aru dikariri nkpà n’ihi unu.

25 Ebe m’tukwasiworo obi m n’ihe a, amataram na m’gānọgide, nọgide kwa n’etiti unu nile, ime ka unu ga n’iru ṅu kwa ọṅù nke okwukwe;

26 ka inya-isi-unu we babiga ókè nime Kraist Jisus n’arum site n’ọbibia m’gābiakute unu ọzọ.

27 Nání nēbinu obi dika ndi ala elu-igwe n’uzọ kwesiri ozi ọma nke Kraist: ka ọ gābu, ma m’bia hu unu ma-ọbu na anọghm, ka m’we nu ihe bayere ọnọdu-unu, na unu nēguzosi ike n’otù Mọ Nsọ, nēwere kwa otù nkpuru-obi lukọrọ okwukwe nke ozi ọma ahu ọ̀gù si-ike;

28 ghara ikwe ka ndi nēmegide unu me ka unu tua ujọ n’ihe ọ bula: ebe nke ahu bu ihe nēme ka ila-n’iyì putara ha ìhè, ma ọ nēme ka nzọputa-unu puta ìhè, nka site-kwa-ra na Chineke;

29 n’ihi na unu ka enyeworo ya n’amara n’ihi Kraist, ọ bughi nání ikwere na Ya, kama ihu kwa ahuhu n’ihi Ya:

30 ebe unu nwere otù nb͕a ahu nke unu huru n’arum, ub͕u a ka unu nānu kwa na ọ di n’arum.

Categories
NDI FILIPAI

NDI FILIPAI 2

1 Ya mere ọ buru na nkasi-obi ọ bula di nime Kraist, ọ buru na ngugu-obi ọ bula nke ihu-n’anya di, ọ buru na nnwekọ ọ bula nke Mọ Nsọ di, ọ buru na obi-ebere na ime-ebere ọ bula di,

2 menu ka ọṅùm juputa, ka unu we tukwasi uche-unu n’otù ihe ahu, nwe kwa otù ihunanya ahu, nēnwekọ otù nkpuru-obi, nēnwe otù uche;

3 unu emela ihe ọ bula n’uzọ ikpa-iche-iche ma-ọbu n’uzọ ichọ otuto efu, kama n’obi di ume-ala nāguritanu ibe-unu na ndi ka unu onwe-unu nma;

4 unu nile n’otù n’otù elela ihe nke aka unu anya, kama unu nile n’otù n’otù le kwa ihe nke madu-ibe-unu anya.

5 Nwenu uche a nime onwe-unu, nke di kwa nime Kraist Jisus:

6 Onye, ọ bu ezie na Ọ diri n’udi nke Chineke na mbu, ma Ọ gughi ya n’ihe O gējidesi ike, bú ira ka Chineke,

7 kama O mere Onwe-ya ihe-efu, n’inara udi nke orù, ewe me Ya n’oyiyi nke madu;

8 ebe ahuru Ya ka Ọ di ka madu n’oyiyi-Ya, O wedakwara Onwe-ya, we buru Onye nāṅa nti rue ọnwu, bú ọnwu nke obe.

9 N’ihi nka Chineke welikwara Ya elu nke-uku, were kwa amara nye Ya aha ahu nke kariri aha nile ọ bula elu;

10 ka ọ gābu n’aha Jisus ka ikperè nile we b͕ue n’ala, nke ihe nile di n’elu-igwe na ihe nile di n’elu uwa na ihe nile di n’okpuru ala,

11 ka ire nile ọ bula we kwuputa kwa na Jisus Kraist bu Onye-nwe-ayi, ka ewe nye Chineke, bú Nna, otuto.

12 Ya mere, ndi m’huru n’anya, dika unu ṅara nti mb͕e nile, ọ bughi nání mb͕e m’nọ n’etiti unu, kama ub͕u a mb͕e m’nānọghi, werenu egwu na ima-jijiji luputa kari nzọputa nke onwe-unu nke-uku;

13 n’ihi na ọ bu Chineke Onye nālusi ọlu ike nime unu ichọ-achọ-unu na ilusi-ọlu-ike-unu, n’ihi na ọ di Ya ezi nma.

14 Menu ihe nile nējighi ntamu na iru-uka ọ bula;

15 ka unu we ghọ ndi nādighi ita uta ndi nāghọghi kwa aghughọ, umu Chineke ndi anāpughi ita uta n’etiti ọb͕ọ b͕agọrọ ab͕agọ nke nēnwe kwa anya-uhie, ndi anāhu unu n’etiti ha dika ndi nēnye ìhè n’uwa,

16 nēche okwu nke ndu n’iru madu; ka m’we nwe ihe inya isi nye n’ubọchi nke Kraist, na ab͕aghi m ọsọ n’efu, na adọb͕ughkwam onwem n’ọlu n’efu

17 E, ọ buru kwa na anāwusim dika àjà-ihe-ọṅuṅu n’elu àjà na ifè-òfùfè nke okwukwe-unu, anamaṅuri ọṅu, so kwa unu nile nāṅuri ọṅu:

18 n’otù uzọ ahu unu onwe-unu, ṅuri-kwa-nu ọṅu, sokwam nāṅuri ọṅu.

19 Ma anamele anya nime Onye-nwe-ayi Jisus na m’gēzigara unu Timọti ọsọsọ, ka mu onwem we nwe kwa obi-utọ, mb͕e m’mara ọnọdu-unu.

20 N’ihi na enweghi m onye ọ bula nke nkpuru-obi-ya yiri nke ya, bú onye gēcheb͕u onwe-ya bayere ọnọdu-unu n’ezie.

21 N’ihi na ha nile nāchọ ihe nke aka ha, ọ bughi ihe nke Jisus Kraist,

22 Ma unu mara ọnwunwa-ya, na, dika nwa nēso nna-ya, otú a ka o sorom buru orù n’izisa ozi ọma.

23 Ya mere, onye a ka m’nēle anya na m’gēziga ya n’otù oge ahu, mb͕e ọ bula m’gāhu otú ọ gādirim:

24 ma anamatukwasi obim nime Onye-nwe-ayi na mu onwem gābia kwa ọsọsọ.

25 Ma anamagu ya ihe di nkpà izigara unu Epafrọdaitọs, bú nwa nna m na onye mu na ya nālukọ ọlu, onye mu na ya nēbukọ kwa agha, onye buru kwa onye-ozi-unu na onye nēfè òfùfè ib͕o nkpàm;

26 ebe agu unu nile nāgusi ya ike, obi lọ-kwa-ra ya miri, n’ihi na unu nuru na aru-ya adighi ike:

27 n’ihi na aru-ya adighi ike n’ezie, ọ nọ kwa nso ọnwu: ma Chineke mere ya ebere; ma ọ bughi nání ya onwe-ya, kama mu onwem kwa, ka m’we ghara inwe ihe-nwuta n’elu ihe-nwuta.

28 Ya mere ọ nānukarim ọku n’obi iziga ya, ka ọ gābu, mb͕e unu huru ya ọzọ, ka unu we ṅuria ọṅu, ka mu onwem we nwe kwa ihe-nwuta nke dikariri ntà.

29 Ya mere werenu ọṅù nile nara ya nke-ọma nime Onye-nwe-ayi; nāsọpuru-kwa-nu ndi di otú a:

30 n’ihi na ọ bu n’ihi ọlu Kraist ka ọ biaruru ọnwu nso, nēkwere itufu ndu-ya, ka o we mezu ihe fọduru unu ime n’ifè-òfùfè-unu n’ebe m’nọ.

Categories
NDI FILIPAI

NDI FILIPAI 3

1 Nke fọduru, umu-nnam, nāṅurinu ọṅu nime Onye-nwe-ayi. Idegara unu otù ihe ndia n’akwukwọ, n’ezie ọ bughi ihe-nsob͕u n’ebe m’nọ, ma n’ebe unu nọ ọ bu ihe-ntukwasi-obi.

2 Lezienu nkita ahu nile anya, lezienu ndi-ọlu ọjọ ahu anya, lezienu obibì-aru ahu anya:

3 n’ihi na ayi onwe-ayi bu ndi obibì-úgwù, ndi ji Mọ nke Chineke nēkpe ekpere, ndi nānya kwa isi nime Kraist Jisus, ndi natukwasighi kwa obi n’anu-aru-ayi:

4 ọ bu ezie na mu onwem puru itukwasi obi ọbuná n’anu aru: ọ buru na onye ọ bula ọzọ nēchè na ya puru itukwasi obi n’anu-aru, mu onwem puru itukwasi obi n’anu-aru kari:

5 ebìrim úgwù n’ubọchi nke-asatọ, esiterem n’umu Israel, site kwa n’ebo Benjamin, abum onye-Hibru nke sitere na ndi-Hibru; n’akuku iwu, abumri onye-Farisi;

6 n’akuku inu-ọku-n’obi, anamesob͕uri nzukọ Kraist; n’akuku ezi omume nke di nime iwu, ahuru na adighi m ita uta.

7 Otú ọ di, ihe ọ bula nke baram urù, ihe ndia ka m’guru n’ihe-iyì n’ihi Kraist-ayi.

8 E, tukwasi kwa, anamagu kwa ihe nile n’ihe-iyì n’ihi ọkika nke ọmuma Kraist Jisus, bú Onye-nwem: Onye m’yiri iyì ihe nile nkem n’ihi Ya, anamagu kwa ha n’ihe-nkpofu, ka m’we rita Kraist n’urù,

9 ewe hum nime Ya, nēnweghi ezi omume ọ bula nke akam, bú nke sitere n’iwu, kama nēnwe ezi omume ahu nke okwukwe ekwere na Kraist nēweta, bú ezi omume ahu nke sitere na Chineke n’elu okwukwe:

10 ka m’we mara Ya, na ike nke nbilite-n’ọnwu-Ya, na nnwekọ nke ahuhu-Ya nile, n’ihi na anēme ka mu na Ya nwekọ otù udi n’ọnwu-Ya;

11 ọ buru na uzọ ọ bula di m’gēsi ru isi na ndi nwuru anwu bilite.

12 Ọ bughi na anataram ya-ri, ma-ọbu na emewom ka m’zue okè ub͕u a: ma anamab͕aso, ka m’we jide, ma ọ buru na ọ gēkwem, ihe ahu nke Kraist Jisus jide-kwa-ram n’ihi ya.

13 Umu-nnam, mu onwem agughi onwem na ejidewom rue ub͕u a: ma otù ihe ka m’nēme, ebe m’nēchezọ ihe nile di n’azu, nēsetipu kwa aka n’ebe ihe nile di n’iru di,

14 anamab͕akuru ókè ib͕a-ọsọ ka m’we nata ihe anāb͕ata n’ọsọ nke ọkpukpọ di elu nke Chineke nime Kraist Jisus.

15 Ya mere, ka ayi ra, bú ndi tozuru okè, ka ayi tukwasi uche na nka: ọ buru kwa na unu tukwasi uche n’ihe ọ bula n’uzọ di iche, ọbuná nka ka Chineke gēkpughere unu:

16 náni nka, n’ihe ahu ayi b͕aruru, ka ayi nāgazi dika ihe ahu si di.

17 Umu-nnam, dinu n’otù n’iṅomim, nēle-kwa-nu ndi nējeghari otú a, otú unu nwere ayi dika ihe-atù

18 N’ihi na ọtutu nējeghari, ndi m’nāgwari unu okwu bayere ha ọtutu oge, ma ub͕u a ọ bu kwa n’ákwá ka m’nāgwa unu, na ha bu ndi-iro obe nke Kraist:

19 ndi ọgwugwu-ha bu ila-n’iyì, ndi chi-ha bu afọ-ha, ndi otuto-ha di kwa n’ihere-ha, ndi nātukwasi uche n’ihe uwa.

20 N’ihi na ala-ayi di n’elu-igwe ub͕u a; site n’ebe ayi nēchesi kwa Onye-nzọputa ike, bú Onye-nwe-ayi Jisus Kraist:

21 Onye gēme aru nke ọnọdu-ayi di ala ka o nwe oyiyi ọhu, ka ya na aru nke ebube-Ya we nwekọ otù udi, dika ilusi-ọlu-ike ahu si di nke O ji pu ọbuná ido ihe nile n’okpuru Onwe-ya.

Categories
NDI FILIPAI

NDI FILIPAI 4

1 Ya mere, umu-nnam m’huru n’anya ndi agu unu nāgusikwam ike, ọṅùm na okpu-ezem, guzosienu ike otú a nime Onye-nwe-ayi, ndi m’huru n’anya.

2 Ariọm Yuodia, ariọkwam Sintiki, ka ha tukwasi uche n’otù ihe ahu nime Onye-nwe-ayi.

3 E, ariọkwam gi, onye ekekọtaworo mu na gi n’ezie n’ọlu Chineke, yere ndinyom ahu aka, n’ihi na mu na ha b͕akọsiri nb͕a ike n’ozi oma, gi na Klement, na ndi fọduru mu na ha nālukọ ọlu, ndi aha-ha di n’akwukwọ nke ndu.

4 Nāṅurinu ọṅu n’Onye-nwe-ayi mb͕e nile: m’gāsi ọzọ, Nāṅurinu ọṅu.

5 Menu ka madu nile mara obi-ọma-unu. Onye-nwe-ayi nọ nso.

6 Unu echeb͕ula onwe-unu n’ihe ọ bula; kama n’ihe nile ọ bula site n’ekpere na aririọ, ya na ekele, menu ka Chineke mara ihe nile unu nāriọ.

7 Udo nke Chineke, nke kachasi uche nile, gēche kwa obi-unu na èchìchè-uche-unu nche nime Kraist Jisus.

8 Nke fọduru, umu-nnam, ka ihe bu ezi-okwu ra, ka ha ra, bú ihe kwesiri nsọpuru, ka ha ra, bú ihe ziri ezi, ka ha ra, bú ihe di ọcha, ka ha ra, bú ihe kwesiri ihu-n’anya, ka ha ra, bú ihe ekwuru nke-ọma; ọ buru na idi-nma ọ bula di, o buru kwa na otuto ọ bula di, nāgukọnu ihe ndia.

9 Ihe unu matara, nke unu nata-kwara, nke unu nu-kwa-ra, nke unu hu-kwa-ra n’arum, nēmenu ihe ndia: Chineke nke udo gānọyere kwa unu.

10 Ma aṅuri rim ọṅu nke-uku nime Onye-nwe-ayi, na ub͕u a n’oge a unu malitere ọhu itukwasi uche n’ihe bayerem; nke unu nātukwasiri uche-unu nime ya n’ezie, ma unu enweghi oghere.

11 Ọ bughi na anamekwu okwu bayere nkpà: n’ihi na mu onwem mutara, n’ọnọdu ọ bula m’nọ, inwezu nime ya ihe nile nākpam nkpà.

12 Amataram uzọ iweda onwem, amata-kwa-ram uzọ ibabiga ókè: n’ihe ọ bula na n’ihe nile ezíwo mu ihe-omimi a, bú inọ n’afọ-ojuju na inọ kwa n’agu, ibabiga ókè na inọ kwa na nkpà.

13 Enwerem ike n’ihe nile nime Onye ahu Nke nēmem ka m’di ike.

14 Otú ọ di, unu mere nke-ọma, n’isom nwekọ nkpab͕um.

15 Ma unu onwe-unu makwara, ndi Filipai, na nime nmalite nke ozi ọma, mb͕e m’siri na Masedọnia puta, ọ dighi nzukọ Kraist ọ bula nke mu na ya nwekọrọ ihe n’okwu bayere onyinye na ọnina, ma-ọbughi nání unu onwe-unu;

16 n’ihi na ọbuná na Tesalọnaika unu zigara otù mb͕e ziga kwa mb͕e ọzọ ib͕om nkpà.

17 Ọ bughi na anamachọ onyinye ahu; kama anamachọ nkpuru ahu nke nāba uba iguyere unu.

18 Ma enwezuwom ihe nile, anamababiga kwa ókè: emewo ka m’zue ezù, ebe m’natara n’aka Epafrọdaitọs ihe nile si n’aka-unu bia, isisì nke ihe ísì utọ, àjà nke anānara nke-ọma, nke nātọ Chineke ezi utọ.

19 Ma Chinekem gēnyezu unu ihe nile ọ bula nākpa unu dika àkù-Ya n’ebube si di, nime Kraist Jisus.

20 Ma otuto diri Chineke-ayi, bú Nna-ayi, rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

21 Kelenu onye nsọ ọ bula nime Kraist Jisus. Umu-nna-ayi ndi mu na ha nọ nēkele unu.

22 Ndi nsọ nile nēkele unu, ma ndi nke èzí-na-ulo Sisa kachasi n’ikele unu.

23 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist dinyere mọ-unu.

Categories
NDI KỌLỌSI

NDI KỌLỌSI 1

1 Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n’ọchichọ Chineke, na Timọti nwa-nna-ayi,

2 nēdegara ndi nọ na Kọlọsi akwukwọ, bú umu-nna-ayi nime Kraist ndi di nsọ kwe-kwa-ra ekwe: Amara diri unu na udo nke si n’aka Chineke, bú Nna-ayi, puta.

3 Ayí nēkele Chineke, bú Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nēkpe ekpere bayere unu mb͕e nile,

4 ebe ayi nuru okwu bayere okwukwe nke unu kwere na Kraist Jisus, na ihu-n’anya unu ji hu ndi nsọ nile,

5 n’ihi olile-anya ahu nke edebeworo unu n’elu-igwe, nke unu nuru ihe bayere ya na mbu n’okwu nke ezi-okwu nke ozi ọma,

6 nke biaruru unu; dika ọ nāmiju kwa nkpuru n’uwa nile, nāba kwa uba, dika ọ nēme kwa n’etiti unu, site n’ubọchi unu nuru mazu kwa amara Chineke n’ezi-okwu;

7 dika unu mutara n’ọnu Epafras orù-ibe-ayi onye ayi huru n’anya, onye bu onye kwesiri ntukwasi-obi n’ijere Kraist ozi n’ọnọdu ayi,

8 onye gosi-kwa-ra ayi ihun-anya-unu nime Mọ Nsọ.

9 N’ihi nka ayi onwe-ayi kwa, site n’ubọchi ayi nuru ya, ayi ewepughi aka n’ikpe ekpere na iriọ aririọ n’ihi unu, ka ewe me ka unu juputa na nmazu nke ihe Ọ nāchọ nime amam-ihe na nghọta nile nke Mọ Nsọ,

10 ka unu jegharia n’uzọ kwesiri Onye-nwe-ayi ime otú ọ gātọ Ya utọ n’uzọ nile, nāmi nkpuru n’ezi ọlu nile ọ bula, nāba kwa uba nime nmazu nke Chineke;

11 ebe anēme ka unu di ike nime ike nile, dika ike nke ebube-Ya si di, rue ntachi-obi na ogologo-ntachi-obi nile, ya na ọṅù;

12 nēkele Nna-ayi, Onye mere ka ayi rue iketa òkè-ayi n’ihe-nketa ndi nsọ n’ìhè;

13 Onye dọputara ayi n’ike nke ọchichiri, we webiga ayi n’ala-eze nke Ọkpara nke ihu-n’anya-Ya;

14 Onye ayi nwere nb͕aputa-ayi nime Ya, bú nb͕aghara nmehie nile ayi:

15 Onye bu onyinyo nke Chineke ahu Nke anāpughi ihu anya, buru kwa onye eburu uzọ mu n’ihe nile ekère èkè;

16 n’ihi na nime Ya ka ekère ihe nile, nke di nime elu-igwe na nke di n’elu uwa, ihe apuru ihu anya na ihe anāpughi ihu anya, ma ọ bu oche-eze, ma-ọbu ibu-ndi-nwe-madu, ma-ọbu ibu-ndi-isi, ma-ọbu ichi-isi; esitewo n’aka-Ya kè ihe nile, ekèwo-kwa-ra Ya ihe nile;

17 Ya onwe-ya bū kwa ihe nile uzọ, ọ bu kwa nime Ya ka ihe nile nēguzokọ n’otù.

18 Ya onwe-ya bu kwa isi aru, nke bu nzukọ-Ya: ebe Ọ bu Onye-nmalite, Onye eburu uzọ mu site na ndi nwuru anwu; ka ewe me ka Ya onwe-ya buru onye mbu n’ihe nile.

19 N’ihi na ọ buri ihe di Nna-Ya ezi nma ka ozuzù nile bigide nìme Ya;

20 ka O we site kwa n’aka-Ya me ka Ya onwe-ya na ihe nile di n’otù, ebe O sitesiri n’ọbara nke obe-Ya me ka Ya onwe-ya na madu di n’udo; site n’aka-Ya, ka m’kwuru, ma ọ bu ihe di n’elu uwa, ma-ọbu ihe di n’elu-igwe.

21 Unu onwe-unu kwa, ọ bu ezie na emereri unu ka unu buru ndi ala ọzọ n’oge gara aga, buru kwa ndi-iro n’èchìchè-uche-unu nime ajọ ọlu nile unu, ma ub͕u a ka O mere ka unu na Ya di n’otù

22 nime aru nke anu-aru-Ya, site n’ọnwu-Ya, iche unu n’iru Ya dika ndi di nsọ, ndi anāpughi kwa ita uta, ndi anāpughi kwa ibo ebubo:

23 ma asi na ọ bu ezie na unu anọgide n’okwukwe-unu, ndi atọworo ntọ-ala, ndi nēguzosi kwa ike, ndi anādighi-ewepu kwa n’olile-anya nke ozi ọma ahu nke unu nuru, nke ekwusara n’etiti ihe nile ekère èkè nke di n’okpuru elu-igwe; nke emere mu onwem, bú Pọl, onye nēje ozi ya.

24 Ub͕u a anamaṅuri ọṅu n’ahuhu m’nāhu n’ihi unu, anamemezu kwa n’akuku nkem ihe fọduru na nkpab͕u nile nke Kraist-ayi n’anu-arum n’ihi aru-Ya, nke bu nzukọ-Ya;

25 nke emere mu onwem onye nējere ya ozi, dika ọlu ọchichi-èzí-na-ulo nke Chineke si di nke enyerem n’ebe unu nọ, ikwuzu okwu Chineke,

26 bú ihe-omimi nke ezoworo ezo site n’oge nile site kwa n’ọb͕ọ nile: ma ub͕u a ka emere ya ka ọ puta ìhè nye ndi nsọ Ya,

27 ndi Chineke chọrọ ime ka ha mara ihe bu àkù nke ebube nke ihe-omimi a n’etiti ndi mba ọzọ, nke bu Kraist nime unu, bú olile-anya nke ebube ahu:

28 Onye ayi nēkwusa, nādu madu nile ọ bula ọdú, nēzí kwa madu nile ọ bula n’amam-ihe nile, ka ayi we che madu nile ọ bula n’iru Onye-nwe-ayi dika ndi zuru okè nime Kraist;

29 anamadọb͕u kwa onwem n’ọlu ime ihe a, nāb͕asi nb͕a ike dika i1usi-ọ1u-ike nke Ya si di, nke nālusi ike nimem n’ike.

Categories
NDI KỌLỌSI

NDI KỌLỌSI 2

1 N’ihi na anamachọ ka unu mata otú m’nāb͕asi nb͕a ike nke-uku n’ihi unu na ndi bi na Leọdisia na ka ha ra, bú ndi akāhughi irum n’anu-aru;

2 ka ewe kasie obi-ha, ebe ejikọ-kwa-ra ha n’ihu-n’anya, ka ha we ru kwa àkù nile nke nkwezu ahu nke nghọta nēkwezu, ka ha we mazu ihe-omimi nke Chineke, bú Kraist,

3 Onye àkù nile nke amam-ihe na ihe-ọmuma di nime Ya, bú ihe zoro ezo nime Ya.

4 Nka ka m’nēkwu, ka onye ọ bula we ghara iwere ire-utọ rafue unu.

5 N’ihi na ọ bu ezie na anọghm n’etiti unu n’anu-arum, ma anọm n’etiti unu na mọm, nāṅuri, nēle kwa usoro-unu na otú okwukwe unu kwere na Kraist di ike.

6 Ya mere dika unu nara Kraist-ayi, bú Jisus Onye-nwe-ayi, nējegharinu nime Ya,

7 buru kwa ndi b͕agideworo nkpọrọgwu nime Ya, ndi anēwuli kwa elu dika ulo nime Ya, ndi anēwere kwa okwukwe-unu me ka unu guzosie ike, dika ezíri unu, nēkelebiga ókè.

8 Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iwere ihu-amam-ihe-n’anya na aghughọ efu nke ya buru onye nēzu unu n’ori, ihu-amam-ihe-n’anya nke di ka ihe-ozizí madu nyere idebe, dika ozizí mbu nke uwa, ma ọ dighi ka Kraist si di:

9 n’ihi na nime Ya ka ozuzù nile nke ihe Chineke bu nēbigide nēwere aru madu,

10 nime Ya ka emezuwo-kwa-ra unu emezu, Onye bu isi nke ibu-onye-isi na ichi-isi nile ọ bula:

11 ọ bu kwa nime Ya ka ejiri obibì-úgwù anējighi aka me bì unu úgwù, n’iyipuchasi aru nile nke bu anu-aru, n’obibì-úgwù nke Kraist;

12 ebe elìkọrọ unu na Ya nime baptism-unu, ọ bu kwa nime ya ka esitere n’aka okwukwe-unu me ka unu so Ya bilikọ, bú okwukwe unu kwere n’ilusi-ọ1u-ike nke Chineke, Onye mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie.

13 Unu onwe-unu kwa, mb͕e unu nọ n’ọnwu site na ndahie nile unu na ebìghi-úgwù nke anu-aru-unu, ọbuná unu ka O mere ka unu so Ya dikọ ndu, mb͕e O weresiri amara b͕aghara ayi ndahie-ayi nile;

14 mb͕e O hichapusi-kwa-ra ihe ayi ji aka-ayi de n’akwukwọ ike onwe-ayi ab͕u, nke megidere ayi, bú ihe edere n’iwu nke enyere ayi, nke nēguzogide ayi: O wepuwo kwa ya n’etiti ayi na Ya, nākpọgide ya n’obe-Ya;

15 mb͕e O yipuchasiri n’aru ibu-ndi-isi nile na ichi-isi nile ihe-agha-ha nye Onwe-ya, O were nkwuwa-okwu gosi ha n’iru ọra, nēdughari ha n’ọṅù-agha n’elu obe-Ya.

16 Ya mere, unu ekwela ka onye ọ bula kpo unu n’oriri, ma-ọbu n’ọṅuṅu, ma-ọbu n’okwu ubọchi ememe ma-ọbu nke ọnwa ọhu ma-ọbu nke ubọchi-izu-ike:

17 nke bu onyinyo nke ihe gaje ibia; ma aru bu nke Kraist.

18 Unu ekwela ka onye ọ bula me ihe ọ nāchọ n’ipunara unu ihe unu nāb͕ata n’ọsọ, site n’obi di ume-ala na ikpere ndi-mọ-ozi, nēguzo n’ihe ọ huworo, onye uche nke anu-aru-ya nāfuli elu n’efu,

19 ọ dighi-ejidesi kwa Isi-ayi ike, Onye aru nile, ebe esitere na nkwonkwo-ya na akwara-ya nile nyezu ya ihe jikọ kwa ya n’otù, o sitere na Ya nāba uba nke Chineke.

20 Ọ buru na unu na Kraist nwukọrọ anwu pua n’ihe-ozizí mbu nke uwa, gini mere, dika agāsi na unu nādi ndu n’uwa, unu nēdo onwe-unu n’okpuru iwu di iche iche enyere,

21 Ejidela, edetu-kwa-la ire, emetu-kwa-la aka

22 (bú ihe agēmebi ha nile emebi n’iji ha me ihe), dika ihe enyere n’iwu na ozizí madu si di?

23 Ọ bu ezie na ihe di otú a nwere nke anākpọ amam-ihe n’ikpe ekpere dika madu chọrọ, n’inwe kwa obi di ume-ala, n’ime kwa ka aru hu ahuhu; ma ha abughi ihe di oké ọnu-ahia ma-ọli megide ime ihe ọjọ nke gēju anu-aru afọ.

Categories
NDI KỌLỌSI

NDI KỌLỌSI 3

1 Ya mere, ọ buru na unu soro Kraist-ayi bilikọ, nāchọnu ihe di n’elu, ebe Kraist-ayi nọ, nānọdu n’aka-nri Chineke.

2 Tukwasinu uche n’ihe di n’elu, ọ bughi n’ihe di n’elu uwa.

3 N’ihi na unu nwuru anwu, ezowo kwa ndu-unu n’ebe Kraist-ayi nọ nime Chineke.

4 Mb͕e ọ bula agēme ka Kraist-ayi puta ìhè, Onye bu ndu-ayi, mb͕e ahu ka agēme kwa ka unu onwe-unu so Ya puta ìhè n’ebube.

5 Ya mere, menu ka ihe nile di unu n’aru nke di n’elu uwa nwua; ikwa-iko, adighi-ọcha, ọchichọ ọjọ, agu ihe ọjọ, na anya-uku ahu, n’ihi na nka bu ikpere arusi;

6 ọ bu kwa n’ihi ihe ndia ka iwe Chineke nābiakwasi umu nke ekweyeghi-ekweye;

7 nke unu onwe-unu jeghariri nime ha n’oge gara aga, mb͕e unu nādi ndu nime ihe ndia.

8 Ma ub͕u a unu onwe-unu, tupu-kwa-nu ihe ndia nile; bú iwe, ọnuma, obi ọjọ, nkwulu, ikwu okwu ihere nēsi n’ọnu-unu puta

9 unu ekwula okwu-ugha gwarita ibe-unu; ebe unu yipuchasiworo madu ochie ahu, ya na omume-ya nile,

10 yikwasi kwa madu ọhu ahu, nke anēme ya ka ọ di ọhu rue na nmazu dika onyinyo nke Onye kère ya si di:

11 ebe onye-Grik na onye-Ju, obibì-úgwù na ebìghi-úgwù, onye nāsu asusu ọzọ, onye Sitia, orù, onye nwere onwe-ya, nāpughi idi: ma Kraist bu ihe nile, di kwa nime madu nile.

12 Ya mere dika ndi Chineke rọputara, ndi di nsọ ndi ahuwo-kwa-ra n’anya, yikwasinu obi ebere, obi-ọma, obi di ume-ala, idi-nwayọ, ogologo-ntachi-obi;

13 nānagideritanu ibe-unu, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, asi na onye ọ bula nwere ihe ita onye ọ bula uta; ọbuná dika Onye-nwe-ayi were amara b͕aghara unu, unu onwe-unu me kwa otú a:

14 ma n’elu ihe ndia nile yikwasinu ihu-n’anya, nke bu ihe-nkekọ nke izu-okè.

15 Ka udo nke Kraist nēkpezi kwa okwu n’obi-unu, nke akpọbata-kwa-ra unu nime ya n’otù aru; buru-kwa-nu ndi nēkele ekele.

16 Kwenu ka okwu Kraist were àkù-ya nile biri nime unu n’amam-ihe nile; werenu abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ nēzírita onwe-unu ihe, nādurita kwa onwe-unu ọdu, nime amara enyere unu nābùnu abù nime obi-unu nye Chineke.

17 Ihe nile ọ bula unu nēme kwa, n’okwu ma-ọbu n’ọlu, nēmenu ha nile n’aha Onye-nwe-ayi Jisus, nēkele Chineke, bú Nna-ayi, site n’aka-Ya.

18 Ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n’okpuru di-unu, dika ọ nēkwesi unu nime Onye-nwe-ayi.

19 Ndi bu di, hunu nwunye-unu n’anya, unu enwe-kwa-la obi ilu n’ebe ha nọ.

20 Umu, nāṅanu nti okwu ndi muru unu n’ihe nile, n’ihi na nka bu ihe nātọ ezi utọ nime Onye-nwe-ayi.

21 Ndi bu nna, akpasula umu-unu iwe, ka obi ghara ifù ha.

22 Ndi-orù, nāṅanu nti okwu ndi bu ndi-nwe-unu n’uzọ anu-aru n’ihe nile; ghara iwere ibu-orù-n’anya nāṅa, dika ndi nēme otú ọ gātọ madu utọ, kama n’afọ-ofufo, nātu egwu Onye-nwe-ayi:

23 ihe ọ bula unu nēme, nālunu ọlu site na nkpuru-obi-unu, dika unu nāluru Onye-nwe-ayi ọlu, ọ bughi kwa madu;

24 ebe unu matara na ọ bu n’aka Onye-nwe-ayi ka unu gānata ihe-nnyeghachi-unu, bú ihe-nketa ahu: unu bu orù nke Onye-nwe-ayi Kraist.

25 N’ihi na onye nēme ajọ omume gānaghachi ajọ omume ahu o mere: ile-madu-anya-n’iru adighi kwa.