Categories
NDI ROM

NDI ROM 15

1 Ma ayi onwe-ayi, bú ndi nwere ike, ayi aghaghi ibū adighi-ike nile nke ndi nēnweghi ike, na ighara ime ihe nātọ onwe-ayi utọ.

2 Onye ọ bula n’etiti ayi, ya me ihe gātọ onye-ab͕ata-obi-ya utọ iwetara ya ezi ihe, ka ọ we wulie ya elu dika ulo.

3 N’ihi na Kraist-ayi emeghi kwa ihe tọrọ Onwe-ya utọ; kama, dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, Ita-uta nile nke ndi nāta Gi uta dakwasirim.

4 N’ihi na ka ha ra, bú ihe edere n’akwukwọ nsọ n’oge gara aga, edere ha izí ayi ihe, ka ayi we were ntachi-obi na nkasi-obi nke ihe nile edeworo n’akwukwọ nsọ nwe olile-anya.

5 Ma ka Chineke nke ntachi-obi na nke nkasi-obi nye unu ka unu tukwasi uche n’otù ihe ahu n’etiti-onwe-unu dika Kraist Jisus si chọ:

6 ka unu we ji otù obi ji kwa otù olu nēnye Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist otuto.

7 N’ihi ya nākpọbatanu ibe-unu, dika Kraist-ayi kpọbata-kwa-ra unu, ka ewe nye Chineke otuto.

8 N’ihi na asim na emewo Kraist ka Ọ buru onye nējere obibì-úgwù ozi n’ihi ezi-okwu Chineke, ka O we me ka nkwa nile ekwere nna-ayi-hà guzosie ike,

9 ka ndi mba ọzọ we nye kwa Chineke otuto n’ihi ebere-Ya; dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si,

N’ihi nka ka M’gēkwuputa Gi n’etiti mba nile,

Aha-Gi ka m’gābùku kwa abù ọma.

10 Ọzọ kwa Ọ si,

Unu mba ọzọ, soronu ndi-Ya nwe obi-utọ.

11 Ọzọ kwa,

Tonu Onye-nwe-ayi, unu mba nile;

Ka ndi nile di iche iche nāja kwa Ya.

12 Ọzọ kwa, Aisaia si,

Nkpọrọgwu ahu nke Jesi gādi,

Na onye ahu Nke nēbili ibu onye-isi mba nile;

Onye ahu ka ndi mba ọzọ gēle anya Ya.

13 Ma Chineke nke olile-anya ahu mejue unu n’ọṅù nile na udo nile n’ikwe-ekwe, ka unu we nwebiga olile-anya ahu ókè, n’ike Mọ Nsọ.

14 Ma emewom ka m’kweye, umu-nnam, ọbuná mu onwem, ihe bayere unu, na unu onwe-unu juputara n’idi-nma, na emejuwo kwa unu n’ihe-ọmuma nile, na unu pu-kwa-ra idurita onwe-unu ọdú.

15 Ma ejikaririm anya-ike degara unu akwukwọ n’otù akuku, dika ọ bu ichetara unu ọzọ, n’ihi amara nke Chineke nyerem,

16 ka m’we buru onye nēfè Kraist Jisus òfùfè ijekuru ndi mba ọzọ, nālu kwa ọlu onye-nchu-àjà nke ozi ọma Chineke, ka ewe me ka iche-ndi-mba-ọzọ-n’iru-Chineke buru ihe agānara nke-ọma, ebe edoro ya nsọ nime Mọ Nsọ.

17 Ya mere enwerem inya-isim nime Kraist Jisus n’ihe nile diri Chineke.

18 N’ihi na m’gaghi-enwe anya-ike ikwu ihe o bula ma-ọbughi n’ihe nile Kraist lutara site n’akam, ime ka ndi mba ọzọ ṅa nti, n’okwu na ọlu,

19 n’ike nke ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche, n’ike nke Mọ Nsọ; ya mere site na Jerusalem, na ala nke di ya gburugburu rue Ilirikọm, ezìzuwom ozi ọma Kraist;

20 ma nka ka m’mere nējisi ike izisa ozi ọma ahu otú a, ọ bughi ebe akpọrọri aha Kraist, ka m’ghara iwu ulo n’elu ntọ-ala onye ọzọ;

21 kama, dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ,

Ha gāhu, bú ndi akākọghi akukọ Ya mb͕e ọ bula,

Ndi akānughi kwa gāghọta.

22 N’ihi nka eb͕ochi-kwa-ram ọtutu oge ndia ibiakute unu:

23 ma ub͕u a, ebe m’nēnweghi ebe ọ bula n’akuku ndia ọzọ, ebe ibiakute unu nāgusikwam ike ọtutu arọ ndia gara aga,

24 mb͕e ọ bula m’gāga Spain (n’ihi na anamele anya na m’gēkiri unu mb͕e m’nāgabiga, anamele kwa anya na unu gēdupum n’ijem iga ebe ahu, ma ọ buru na afọ gēburu uzọ jum n’aru unu n’akuku ufọdu)

25 ma ub͕u a, ka m’kwuru, agam Jerusalem, ebe m’nējere ndi nsọ ozi.

26 N’ihi na ọ di Masedọnia na Akaia ezi nma inye ndi-ob͕eye n’etiti ndi nsọ nọ na Jerusalem ihe ufọdu ha gēnwekọ.

27 N’ihi na ọ di ha ezi nma; ha bu kwa ndi ji ndi ahu ugwọ. N’ihi na asi na ndi mba ọzọ nwekọrọ ihe Mọ Nsọ nke ha, ha ji kwa ugwọ ifè ha òfùfè n’ihe nke anu-aru.

28 Ya mere mb͕e m’mezusiri nka, ka-kwa-ra ha nkpuru a akàrà, m’gēsi na nke unu je Spain.

29 Ma amataram na, mb͕e m’biakutere unu, ọ bu nime ozuzù ngọzi nke Kraist ka m’gābia.

30 Ma, umu-nnam, ewerem Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, were kwa ihu-n’anya Mọ Nsọ, nāriọ unu, ka unu som nāb͕asi nb͕a ike n’ekpere unu nēkpere Chineke n’ihim;

31 Ka ewe dọputam n’aka ndi nēkweyeghi ekwenye ndi nọ na Judia, ka ije-ozim nke m’ji je Jerusalem we búru kwa ihe ndi nsọ gānara nke-ọma;

32 ka m’we biakute unu n’ọṅù site n’ọchichọ Chineke, ka mu na unu we zukọ kwa ike.

33 Ma ka Chineke nke udo nọyere unu nile. Amen.

Categories
NDI ROM

NDI ROM 16

1 Ma anameme ka unu mara Fibi nwa-nna-ayi nwanyi, onye nējere nzukọ Kraist nke di na Kenkrii ozi:

2 ka unu we nara ya nke-ọma nime Onye-nwe-ayi, dika o kwesiri ndi nsọ, ka unu nēguzo kwa ya nso iyere ya aka n’okwu ọ bula nkpà unu gākpa ya: n’ihi na ya onwe-ya aburuwo kwa onye nēguzoro ọtutu madu izọ ha, mu onwem kwa.

3 Kelenu Priska na Akwila ndi mu na ha nālukọ ọlu nime Kraist Jisus,

4 madu ndi tọb͕ọrọ olu nke aka ha n’ihi ndum; ndi ọ bughi nání mu onwem nēkele, kama nzukọ Kraist nile nke ndi mba ọzọ kwa:

5 kele-kwa-nu nzukọ Kraist nke di n’ulo-ha. Kelenu Epinetọs onye m’huru n’anya, onye bu nkpuru mbu nke Esia nye Kraist.

6 Kelenu Meri, n’ihi na ọ dọb͕uru onwe-ya n’ọlu n’ọtutu ihe nye unu.

7 Kelenu Andrọnaikọs na Junias, ndi-ikwum, ndi adọkọ-kwa-ra mu na ha n’agha, madu ndi amara aha-ha n’etiti ndi-ozi, ndi bu-kwa-ram uzọ bia nọ nime Kraist.

8 Kelenu Amplietọs, onye m’huru n’anya nime Onye-nwe-ayi.

9 Kelenu Uabenọs, onye ayi na ya nālukọ ọlu nime Kraist, na Stakis onye m’huru n’anya.

10 Kelenu Apelis onye anwaputaworo nime Kraist. Kelenu ndi sitere n’èzí-na-ulo nke Aristọbulọs.

11 Kelenu Hirọdion onye-ikwum. Kelenu ndi sitere n’èzi-na-ulo nke Nasisọs, ndi nọ nime Onye-nwe-ayi.

12 Kelenu Traifina na Traifosa ndi nādọb͕u onwe-ha n’ọlu nime Onye-nwe-ayi. Kelenu Pasis onye ahuru n’anya, n’ihi na ọ dọb͕uru onwe-ya n’ọlu n’ọtutu ihe nime Onye-nwe-ayi.

13 Kelenu Rufọs onye arọputara nime Onye-nwe-ayi, na nne-ya nke bu kwa nnem.

14 Kelenu Asinkritọs, Flegon, Hamis, Patrọbas, Hamas, na umu-nna ndi ha na ha nọ.

15 Kelenu Filọlọgọs na Julia, Nireọs na nwa-nne-ya nwayi, na Ọlimpas, na ndi nsọ nile ndi ha na ha nọ.

16 Werenu isutu-ọnu di nsọ kelerita onwe-unu. Nzukọ Kraist nile nēkele unu.

17 Ma anamariọ unu, umu-nnam, ka unu le ha anya, bú ndi nēweta nkewa di iche iche ahu na ọnyà di iche iche ahu, nēmegide ozizí nke unu onwe-unu mutara: ka unu nēze kwa ha.

18 N’ihi na ndi di otú a abughi orù nke Onye-nwe-ayi Kraist, kama orù nke afọ nke ha; ha were kwa okwu utọ ha na okwu ọma ha nāghọb͕u obi ndi nāmaghi ihe ọjọ.

19 N’ihi na iṅa-nti-unu eruzuwo na nti madu nile. Ya mere anamaṅuri ọṅu n’isi unu: ma anamachọ ka unu buru ndi-amam-ihe n’ebe ezi ihe di, ma ndi arughi-árú n’ebe ihe ọjọ di.

20 Ma Chineke nke udo gāzọpia Setan n’okpuru ukwu-unu ọsọsọ.

Amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu.

21 Timọti onye mu na ya nālukọ ọlu nēkele unu; na Lusiọs na Jeson na Sosipata, ndi-ikwum.

22 Mu onwem, bú Tatiọs, onye nēde akwukwọ-ozi a, nēkele unu nime Onye-nwe-ayi.

23 Gaiọs, onye nēlem na nzukọ Kraist dum ọbìa, nēkele unu. Erastọs onye nāchi ihe obodo nēkele unu, na Kwọtọs nwa-nna-ayi.

24 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu nile. Amen.

25 Ma Onye ahu Nke puru ime ka unu guzosie ike dika ozi ọmam na nkwusa nke Jisus Kraist si di, dika nkpughe nke ihe-omimi ahu si di nke emeworo ka o kpuchie ọnu n’oge ebighi-ebi,

26 ma ub͕u a ka emere ka ọ puta ìhè, esite kwa n’ihe ndi-amuma deworo n’akwukwọ me ka mba nile mara ya, dika ihe Chineke ebighi-ebi nyere n’iwu si di, rue iṅa-nti nke okwukwe;

27 Chineke Nke nání Ya bu Onye-amam-ihe, site n’aka Jisus Kraist, Onye otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

Categories
I. NDI KỌRINT

I. NDI KỌRINT 1

1 Pọl, onye akpọrọ ibu onye-ozi nke Jisus Kraist site n’ọchichọ nke Chineke, na Sostenis nwa-nna-ayi,

2 nēdegara nzukọ Chineke nke di na Kọrint akwukwọ, bú ndi edoworo nsọ nime Kraist Jisus, ndi akpọrọ ibu ndi nsọ, ha na ndi nile nākpọku aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist n’ebe nile, bú Onye-nwe ayi na ha:

3 Amara diri unu na udo nke si n’aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.

4 Anamekelere unu Chinekem mb͕e nile, n’ihi amara nke Chineke nke enyere unu nime Kraist Jisus;

5 na n’ihe nile ọ bula emere unu ndi-ọgaranya nime Ya, n’okwu nile na ọmuma nile;

6 dika emere ka àmà nke Kraist guzosie ike nime unu:

7 nke mere na ọ dighi onyinye-amara fọduru nke unu nēnweghi; unu nēche kwa nkpughe Onye-nwe-ayi Jisus Kraist;

8 Onye gēme kwa ka unu guzosie ike rue ọgwugwu ihe nile, buru ndi anāpughi ibo ebubo n’ubọchi Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.

9 Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye esitere n’aka Ya kpọbata unu na nnwekọ nke Ọkpara-Ya Jisus Kraist Onye-nwe-ayi.

10 Ma, umu-nnam, esiterem n’aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist riọ unu, ka unu nile nēkwu otù ihe, ka nkewa ghara kwa idi n’etiti unu; kama ka eme unu ka unu zue okè n’otù uche ahu na n’otù ìzù ahu.

11 N’ihi na ndi èzí-na-ulo Kloi gosirim ihe bayere unu, umu-nnam, na esem-okwu di n’etiti unu.

12 Ihe m’nēkwu bu nka, na unu nile n’otù n’otù nāsi, Mu onwem bu nke Pọl; mu onwem bu kwa nke Apọlos; mu onwem bu kwa nke Kifas; mu onwem bu kwa nke Kraist.

13 Èkèwo Kraist èkè? ọ̀ gābu na akpọgidere Pọl n’obe n’ihi unu? mà-ọbu na emere unu baptism ibà n’aha Pọl?

14 Anamekele Chineke na ọ dighi onye ọ bula n’etiti unu m’mere baptism, ma-ọbughi Krispọs na Gaiọs;

15 ka onye ọ bula ghara isi na emere unu baptism ibà n’aha nkem.

16 Ma eme-kwa-ram èzí-na-ulo Stefanas baptism: ma ewepu ndia, amataghm ma emerem onye ọ bula ọzọ baptism.

17 N’ihi na Kraist eziteghm ime baptism, kama izisa ozi ọma: ọ bughi n’amam-ihe nke okwu, ka aghara ime ka obe Kraist buru ihe-efu.

18 N’ihi na okwu nke obe buru ndi nāla n’iyì ihe-nzuzu; ma ọ buru ayi, bú ndi anāzọputa, ike nke Chineke.

19 N’ihi na edewo ya n’akwukwọ nsọ, si,

M’gāla amam-ihe nke ndi mara ihe n’iyì,

M’gāju kwa nghọta nke ndi nwere nghọta.

20 Òle ebe onye mara ihe nọ? òle ebe ode-akwukwọ nọ? òle ebe onye oge a, onye ya na ibe-ya nājurita ajuju, nọ? Chìneke emeghi ka amam-ihe uwa buru ihe-nzuzu?

21 N’ihi na ebe uwa n’amam-ihe nke Chineke nējighi amam-ihe-ya mara Chineke, ọ di Chineke ezi nma iji ihe-nzuzu nke ihe ahu anēkwusa izọputa ndi kwere.

22 Ebe ndi-Ju nāriọ ihe-iriba-ama di iche iche, ndi-Grik nāchọ kwa amam-ihe:

23 ma ayi onwe-ayi nēkwusa Kraist, na akpọgidere Ya n’obe, Onye buru ndi-Ju ọnyà, buru kwa ndi mba ọzọ ihe-nzuzu;

24 ma Ọ buru ndi akpọrọ, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, Kraist, bú ike nke Chineke, na amam-ihe nke Chineke.

25 N’ihi na ihe-nzuzu nke Chineke kariri madu nile n’amam-ihe; adighi-ike nke Chineke kariri kwa madu nile n’ike.

26 N’ihi na lenu ọkpukpọ-unu, umu-nnam, na ọ dighi ọtutu ndi mara ihe dika anu-aru si mara ihe, ọ dighi ọtutu ndi-ike, ọ dighi ọtutu ndi amazuru aha-ha, ka akpọrọ:

27 Kama ọ bu ihe-nzuzu nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ndi mara ihe; ọ bu kwa ihe nādighi ike nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ihe di ike;

28 ọ bu kwa ihe di ala nke uwa, na ihe akpọrọ ihe-efu, ka Chineke rọputara, bú ihe nke nādighi, ka O we me ka ihe nke nādi ghara idi irè:

29 ka anu-aru nile, bú madu, we ghara inya isi n’iru Chineke.

30 Ma unu onwe-unu sitere na Ya di nime Kraist Jisus, Onye ghọrọ amam-ihe nye ayi site na Chineke, bú ezi omume, na ido-nsọ kwa, na nb͕aputa:

31 ka, dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, Onye nānya isi, ya nya n’Onye-nwe-ayi.

Categories
I. NDI KỌRINT

I. NDI KỌRINT 2

1 Mu onwem kwa, umu-nnam, mb͕e m’biakutere unu, abiaghm n’ọ̀kà okwu ma-ọbu n’ọ̀kà amam-ihe, nēkwusara unu àmà nke Chineke.

2 N’ihi na ezuberem ka m’ghara imata ihe ọ bula n’etiti unu, ma-ọbughi Jisus Kraist, ka m’mata kwa Onye ahu ka onye akpọgideworo n’obe.

3 Mu onwem nọ kwa n’etiti unu n’adighi-ike, na n’egwu, na n’oké ima-jijiji.

4 Okwum na ihe m’kwusara abughi kwa n’okwu amam-ihe, ime ka madu kweye, kama ha bu na ngosi nke Mọ Nsọ na nke ike:

5 ka okwukwe-unu we ghara idi n’amam-ihe madu, kama n’ike nke Chineke.

6 Otú ọ di, amam-ihe bu ihe ayi nēkwu n’etiti ndi tozuru okè: ma ọ bu amam-ihe nke nābughi nke oge a, ọ bughi kwa nke ndi-isi oge a, ndi anēme ka ha ghara idi irè:

7 kama ihe ayi nēkwu bu amam-ihe Chineke n’ihe-omimi, bú amam-ihe nke ezobeworo, nke Chineke buru uzọ ka àkà mb͕e oge ndia akērughi, iwetara ayi otuto:

8 nke ọ dighi onye ọ bula n’etiti ndi-isi oge a mara: n’ihi na asi na ha mara ya-ri, ha agaghi-akpọgidewori Onye-nwe ebube n’obe:

9 kama dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si,

Ihe anya nāhughi, nke nti nānughi kwa,

Nke nābàghi kwa n’obi madu,

Ka ha ra, bú ihe Chineke doziri ndi huru Ya n’anya.

10 Ma ọ bu ayi onwe-ayi ka Chineke kpughere ha site n’aka Mọ Nsọ: n’ihi na Mọ Nsọ nēnyocha ihe nile, ọbuná ihe nile di omimi nke Chineke.

11 N’ihi na ònye n’etiti madu matara ihe nile nke madu, ma-ọbughi mọ nke madu ahu, nke di nime ya? ọbuná otú a ọ dighi onye mara ihe nke Chineke, ma-ọbughi Mọ nke Chineke.

12 Ma ayi onwe-ayi anataghi mọ nke uwa, kama ọ bu Mọ Nke sitere na Chineke; ka ayi we mata ihe nile Chineke were amara nye ayi.

13 Ọ bu kwa ihe ndia ka ayi nēkwu, ọ bughi n’okwu nke amam-ihe madu nēzí, kama n’okwu nke Mọ Nsọ nēzí; ayi nēwere kwa ihe nke Mọ Nsọ tule ihe nke Mọ Nsọ.

14 Ma madu nke nkpuru-obi onwe-ya nāchi adighi-anata ihe nke Mọ nke Chineke: n’ihi na ha bu ihe-nzuzu n’anya-ya; ọ pughi kwa imara ha, n’ihi na ewere Mọ Nsọ sikwuputa ha.

15 Ma onye Mọ Nsọ nāchi nēsikwuputa ihe nile, ma ọ dighi onye ọ bula nēsikwuputa ya onwe-ya.

16 N’ihi na ònye mara uche Onye-nwe-ayi, ka o zí Ya ihe? Ma ayi onwe-ayi nwere uche nke Kraist.

Categories
I. NDI KỌRINT

I. NDI KỌRINT 3

1 Mu onwem kwa, umu-nnam, apughi m igwa unu okwu dika ndi Mọ Nsọ nāchi, kama dika ndi bu nání anu-aru, dika umu ọhu nime Kraist.

2 Ejirim ara zù unu, ọ bughi ihe-oriri; n’ihi na unu akāpughi inagide ya; é-è, ọbuná ub͕u a unu apughi;

3 n’ihi na unu bu ndi anu-aru nāchi rue ub͕u a: n’ihi na ebe ekworo na esem-okwu di n’etiti unu, ùnu abughi ndi anu-aru nāchi, ndi nējeghari kwa dika madu?

4 N’ihi na mb͕e ọ bula otù onye nāsi, Mu onwem bu nke Pọl; mb͕e ibe-ya nāsi kwa, Mu onwem bu nke Apọlos; ùnu abughi madu efu?

5 Gini kwa bu Apọlos? gini bu kwa Pọl? Ndi nēje ozi, ndi unu si n’aka-ha kwere; dika Onye-nwe-ayi nye-kwa-ra ha abua n’otù n’otù.

6 Mu onwem kuru osisi, Apọlos kwọsara ya miri; ma ọ bu Chineke nēme ka ọ nāba uba.

7 Ya mere onye nāku abughi ihe ọ bula, onye nākwọsa miri abughi kwa ihe ọ bula; kama Chineke, Onye nēme ka ọ nāba uba, bu ihe nile.

8 Ma onye nāku na onye nākwọsa miri bu otù: ma ha abua n’otù n’otù gānata ugwọ-ọlu nke aka ha, onye ọ bula dika ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n’ọlu si di.

9 N’ihi na ayi bu ndi ha na Chineke nālukọ ọlu: unu bu ubi Chineke, buru kwa ulo Chineke nēwu.

10 Dika amara Chineke nke enyerem si di, dika onye-isi-ọ̀kà nke mara ihe, atọrọm ntọ-ala; onye ọzọ nēwu kwa ulo n’elu ya. Ma ka onye ọ bula lezi anya otú ọ nēwu ulo n’elu ya.

11 N’ihi na ọ dighi onye ọ bula puru itọ ntọ-ala ọzọ ma-ọbughi Nke atọworo, Nke bu Jisus Kraist.

12 Ma ọ buru na onye ọ bula ewukwasi ọla-edo, ọla-ọcha, nkume di oké ọnu, osisi, ahihia, okporo-ọka, n’elu ntọ-ala ahu;

13 agēme ka ọlu nke madu nile n’otù n’otù puta ìhè: n’ihi na ubọchi ahu gēgosi ya, n’ihi na agaje ikpughe ya n’ọku; ọku onwe-ya gānwa kwa ọlu madu nile n’otù n’otù, aha ọlu ọ bu.

14 Ọ buru na ọlu onye ọ bula gādigide nke o wukwasiri ya, ọ gānata ugwọ-ọlu.

15 Ọ buru na agērechapu ọlu onye ọ bula n’ọku, ọ gēyi iyì: ma agāzọputa ya onwe-ya; ma ọ bu dika onye azọputara n’ọku.

16 Ùnu amataghi na unu bu ulo nsọ Chineke, Mọ nke Chineke bi kwa nime unu?

17 Ọ buru na onye ọ bula emebi ulo nsọ Chineke, onye ahu ka Chineke gēmebi; n’ihi na ulo nsọ Chineke di nsọ, otú a ka unu di kwa.

18 Ka onye ọ bula ghara ighọb͕u onwe-ya. Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye mara ihe n’etiti unu n’oge a, ya ghọ onye-nzuzu, ka o we ghọ onye mara ihe.

19 N’ihi na amam-ihe nke uwa nka bu ihe-nzuzu n’ebe Chineke nọ. N’ihi na edewo ya n’akwukwọ nsọ, si, Onye nējide ndi mara ihe n’aghughọ-ha:

20 ọzọ kwa, Onye-nwe-ayi mara ihe ndi mara ihe nātule n’obi-ha, na ha bu ihe-efu.

21 Ya mere onye ọ bula anyala isi na madu. N’ihi na ihe nile bu nke unu;

22 ma ọ bu Pọl, ma-ọbu Apọlos, ma-ọbu Kifas, ma-ọbu uwa, ma-ọbu ndu ma-ọbu ọnwu, ma-ọbu ihe di ub͕u a, ma-ọbu ihe gaje idi; ihe nile bu nke unu;

23 ma unu onwe-unu bu ndi nke Kraist; ma Kraist bu nke Chineke.

Categories
I. NDI KỌRINT

I. NDI KỌRINT 4

1 Ka madu nāgu ayi otú a, dika ndi nējere Kraist ozi, ndi bu kwa ndi nāchi èzí-na-ulo n’ihe-omimi nke Chineke.

2 N’ebe a ihe anāchọ kwa n’aka ndi nāchi èzí-na-ulo bu, ka ahu onye ọ bula na o kwesiri ntukwasi-obi.

3 Ma ọ burum ihe dikarisiri ntà ka unu, ma-ọbu ubọchi ikpé nke madu, kpem ikpé: é-è, ekpeghi m ọbuná onwem ikpé.

4 N’ihi na ọ dighi ihe ọ bula m’mara megide onwem; ma ọ bughi na nka ka aguworom n’onye ezi omume: kama Onye nēkpem ikpé bu Onye-nwe-ayi.

5 Ya mere, unu ekpela ihe ọ bula ikpé mb͕e oge ahu akērughi, rue mb͕e ọ bula Onye-nwe-ayi gābia, Onye gēweputa kwa ihe nile ezoro ezo nke ọchichiri n’ìhè, me kwa ka ìzù nile nke obi nile puta ìhè; mb͕e ahu ka madu nile n’otù n’otù gēnwe kwa otuto-ha site n’aka Chineke.

6 Ma ihe ndia, umu-nnam, ka m’mere ka ha ghọ mu onwem na Apọlos n’oyiyi n’ihi unu; ka unu we muta nime ayi ozizì a, Unu agabigala ihe edeworo n’akwukwọ, ka unu we ghara ifuli onwe-unu elu, otù onye n’ihi otù onye megide madu-ibe-ya.

7 N’ihi na Ònye nākpa ókè n’etiti gi na madu-ibe-gi? ọ̀ bu gini kwa ka i nwere nke i nānataghi? ma ọ buru na i natara ya, gini mere i nānya isi, dika agāsi na i nataghi ya?

8 Ọbuná ub͕u a unu erijuwo afọ, ọbuná ub͕u a unu ghọrọ ọgaranya, unu buru eze mb͕e ayi onwe-ayi nānọghi ya: e, ọ gādim nọ̄ mma, ma asi na unu buru eze n’ezie, ka ayi onwe-ayi we so kwa unu buru eze.

9 N’ihi na anamechè na Chineke were ayi, bú ndi-ozi, gosi, dika ndi-ikpe-azu, dika ndi amara ikpé ọnwu: n’ihi na emere ayi ihe-nkiri nye uwa na ndi-mọ-ozi na madu.

10 Ayi onwe-ayi bu ndi-nzuzu n’ihi Kraist, ma unu onwe-unu bu ndi nwere uche nime Kraist; ayi onwe-ayi adighi ike, ma unu onwe-unu di ike; anēnye unu onwe-unu otuto, ma anēme ayi onwe-ayi ihe-ihere.

11 We rue oge hour di ub͕u a agu nāgu ayi, akpiri nākpọ kwa ayi nku, ayi nāb͕a kwa ọtọ, anēti kwa ayi aka, ayi enweghi kwa ebe-obibi;

12 ayi nādọb͕u kwa onwe-ayi n’ọlu, were aka-ayi nālu ọlu: mb͕e anēkwutọ ayi, ayi nāgọzi: mb͕e anēsob͕u ayi, ayi nānagide:

13 mb͕e anēkwulu ayi, ayi nāriọ aririọ; emere ka ayi buru dika ihe asachapuru n’uwa, ihe ehichapuru n’ihe nile, rue ub͕u a.

14 Edeghi m ihe ndia n’akwukwọ dika anameme unu ihe-ihere n’iru, kama dika anamadu unu ọdú, dika umum m’huru n’anya.

15 N’ihi na asi na unu nwere orú nnù ndi-ozizí na nnù ndi-ozizí ise nime Kraist, ma unu enweghi ọtutu nna: n’ihi na mu onwem nime Kraist Jisus were ozi ọma mu unu.

16 Ya mere ariọm unu, burunu ndi nēṅomim.

17 N’ihi nka ka m’zitere unu Timọti, onye bu nwam nime Onye-nwe-ayi, buru kwa onye m’huru n’anya, onye kwesiri ntukwasi-obi, ọ gēchetara unu uzọm nile nke di nime Kraist, dika m’nēzí n’ebe nile na nzukọ Kraist nile ọ bula.

18 Ma ufọdu fuliri onwe-ha elu, dika agāsi na m’gaghi-abiakute unu.

19 Ma m’gābiakute unu ọsọsọ, ma ọ buru na Onye-nwe-ayi chọrọ; m’gāmara kwa, ọ bughi okwu nke ndi fuliworo onwe-ha, kama ike-ha.

20 N’ihi na ala-eze Chineke adighi n’okwu-ọnu, kama n’ike.

21 Gini ka unu nāchọ? ọ̀ bu utari ka m’gēwere biakute unu, ma-ọbu ihu-n’anya na mọ nke idi-nwayọ?

Categories
I. NDI KỌRINT

I. NDI KỌRINT 5

1 Anānu nọ̄ na ikwa-iko di n’etiti unu, aha ikwa-iko nke nādighi kwa ọbuná n’etiti ndi mba ọzọ, nke mere na otú onye n’etiti unu nwere nwunye nna-ya.

2 Unu onwe-unu afuliwo kwa onwe-unu elu, unu erughi kwa újú kama nke ahu, ka ewe wepu onye ahu n’etiti unu, bú onye luru ọlu a.

3 N’ihi na mu onwem n’ezie, ebe m’nānọghi n’etiti unu n’arum, ma anọm n’etiti unu na mọm, ekpewom onye ahu nke lutara nka otú a ikpé ọbuná ub͕u a, dika agāsi na anọm,

4 n’aha nke Onye-nwe-ayi Jisus, mb͕e unu zukọrọ, mọm nēso kwa unu, ya na ike nke Onye-nwe-ayi Jisus,

5 irara onye di otú a nye n’aka Setan ibibi anu-aru-ya, ka ewe zọputa mọ-ya n’ubọchi Onye-nwe-ayi Jisus.

6 Ihe-inya-isi-unu adighi nma. Ùnu amataghi na ihe-iko-achicha di ntà nēko ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ dum?

7 Sachapunu ihe-iko-achicha ochie, ka unu we buru ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ ọhu, dika unu bu achicha ekoghi-eko. N’ihi na achu-kwa-ra àjà-ngabiga-ayi, bú Kraist:

8 ya mere, ka ayi nēme ememe ahu, ọ bughi n’ihe-iko-achicha ochie, ọ bughi kwa n’ihe-iko-achicha nke bu obi ọjọ na ajọ ọlu, kama n’achicha ekoghi-eko nke bu idi-ọcha na ezi-okwu.

9 Edegaram unu n’akwukwọ-ozim ka unu na ndi nākwa iko ghara imekọ ihe;

10 ọ bughi ndi nke uwa nka ndi nākwa iko ma-ọli, ma-ọbu ndi-anya-uku-ya na ndi nāpunara madu ihe, ma-ọbu ndi nēkpere arusi: ebe ọ gādi unu nkpà isi n’uwa pua ma asi na unu eme otú a:

11 ma otú ọ di, edegaram unu ka unu na onye ọ bula nke anākpọ ya aha na ọ bu nwa-nna ghara imekọ ihe, ma ọ buru na onye ahu bu onye nākwa iko, ma-ọbu onye-anya-uku, ma-ọbu onye nēkpere arusi, ma-ọbu onye-nkwutọ, ma-ọbu onye nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu onye nāpunara madu ihe; ka unu na onye di otú a ghara ọbuná irikọ ihe.

12 N’ihi na òle ihe bu nkem ikpe ndi nọ n’èzí ikpé? Ọ̀ bughi ndi nọ n’ime ka unu onwe-unu nēkpe?

13 ma Chineke nēkpe ndi nọ n’èzí ikpé. Wepunu ajọ onye ahu n’etiti onwe-unu.

Categories
I. NDI KỌRINT

I. NDI KỌRINT 6

1 Ọ̀ di onye ọ bula n’etiti unu, ma asi na o nwere okwu megide ibe-ya, nwere anya-ike ije ikpé n’iru ndi ajọ omume, ma ọ bughi n’iru ndi nsọ?

2 Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi nsọ gēkpe uwa ikpé? ọ buru kwa na agaje ikpe uwa n’iru unu, ùnu ekwesighi inọ dika ndi-ikpé n’ulo-ikpé dikarisiri ntà?

3 Ùnu amataghi na ayi gēkpe ndi-mọ-ozi ikpé? àyi gēsi aṅa ghara inwe ike ikpe ihe nke ndu a?

4 Ya mere asi na unu nwere ulo-ikpé diri ndu a n’ezie, menu ka ndi ahu nọdu dika ndi-ikpé, bú ndi anākpọ ihe-efu n’etiti nzukọ Kraist.

5 Anamekwu nka ka m’me unu ihe-ihere n’iru. Ọ̀ di otú a, na ọ dighi otù onye mara ihe nọ n’etiti unu, onye gāpu ikpe ikpé n’etiti nwa-nna-ya na ibe-ya,

6 kama nwa-nna nēwere nwa-nna-ya je ikpé, nka bu kwa n’iru ndi nēkweghi ekwe?

7 Ezie ọ bu nọ̄ ila-ala n’ebe unu nọ ọbuná ub͕u a, na unu nwere okwu ikpé n’etiti onwe-unu. Kari nke ahu, n’ìhi gini unu adighi-ekwe ka emegide unu ajọ omume? kari nke ahu, n’ìhi gini unu adighi-ekwe ka emeb͕ue unu?

8 É-è, kama unu onwe-unu nēme ajọ omume, nēmeb͕u kwa, nka ka unu nēme kwa umu-nna-unu.

9 Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi ajọ omume agaghi-eketa ala-eze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu: ndi nākwa iko, ma-ọbu ndi nēkpere arusi, ma-ọbu ndikom nākwa iko, bú ndi nwere nwunye, ma-ọbu ndikom nēme dika ndinyom, ma-ọbu ndikom nēmeru onwe-ha n’aru ndikom,

10 ma-ọbu ndi-ori, ma-ọbu ndi-anya-uku, ma-ọbu ndi nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu ndi-nkwutọ, ma-ọbu ndi nāpunara madu ihe, ha agaghi-eketa ala-eze Chineke.

11 Otú a ka ufọdu n’etiti unu di-kwa-ri: ma unu sachara onwe-unu, ma edoro unu nsọ, ma aguru unu na ndi ezi omume n’aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ya na nime Mọ nke Chineke-ayi.

12 Ihe nile zirim ezi n’iwu; ma ọ bughi ihe nile nābaram urù. Ihe nile zirim ezi n’iwu; ma ọ dighi ihe ọ bula gāchi mu onwem.

13 Ihe-oriri nile diri afọ, afọ di-kwa-ra ihe-oriri nile: ma Chineke gēme ka ya na ha ghara idi irè. Ma aru-ayi adirighi ikwa-iko, kama ọ diri Onye-nwe-ayi; Onye-nwe-ayi di-kwa-ra aru-ayi:

14 ma Chineke mere ka Onye-nwe-ayi si n’ọnwu bilie, Ọ gēsite kwa n’ike-Ya me ka ayi onwe-ayi si n’ọnwu bilie.

15 Ùnu amataghi na aru-unu bu ihe di n’aru Kraist? #m’gēwepu kwa ihe di n’aru Kraist, me ha ka ha buru ihe di n’aru nwanyi nākwa iko? Chineke ekwela.

16 Ma-ọbu ùnu amataghi na onye nārapara n’aru nwanyi nke nākwa iko, ya na ya bu otù aru? n’ihi na, Ha abua ka O kwuru, gāghọ otù anu-aru.

17 Ma onye nārapara n’aru Onye-nwe-ayi, ya na Ya bu otù mọ.

18 B͕anarinu ikwa-iko. Nmehie nile ọ bula nke madu nēme di n’elu aru; ma onye nākwa iko nēmehie megide aru nke onwe-ya.

19 Ma-ọbu ùnu amataghi na aru-unu bu ulo nsọ nke Mọ Nsọ, Onye bi nime unu, Onye unu nwere site na Chineke? ọ bughi kwa unu onwe-unu nwe onwe-unu;

20 n’ihi na ewere ọnu-ahia b͕ara unu: ya mere nyenu Chineke otuto n’aru-unu.

Categories
I. NDI KỌRINT

I. NDI KỌRINT 7

1 Ma okwu bayere ihe unu dere akwukwọ bayere ha: Ọ di nma ka nwoke ghara imetu nwanyi aka.

2 Ma, n’ihi ikwa-iko nile, ka nwoke ọ bula nwe nwunye nke aka ya, ka nwanyi ọ bula nwe kwa di nke aka ya.

3 Ka di kwughachi nwunye-ya ugwọ o ji ya: otú a kwa ka nwunye kwughachi kwa di-ya ugwọ o ji ya.

4 Ọ bughi nwunye nāchi aru nke onwe-ya, kama ọ bu di-ya: otú a kwa ọ bughi di nāchi kwa aru nke onwe-ya, kama ọ bu nwunye-ya.

5 Unu emeb͕ula onwe-unu, ma-ọbughi ma eleghi anya unu gēsite n’inwe otù olu me ya na nwa oge, ka unu we nwe oghere ikpe ekpere, we nọkọ kwa ọzọ, ka Setan we ghara inwa unu n’ihi na unu apughi ijide onwe-unu.

6 Ma anamekwu nka n’uzọ nkweye, ọ bughi n’uzọ ihe enyere n’iwu.

7 Ma anamachọ ka madu nile di ka mu onwem di kwa. Otú ọ di, madu nile n’otù n’otù nwere onyinye-amara nke aka ha site na Chineke, otù onye otú a, onye ọzọ otú a kwa.

8 Ma asim ndi nānọghi n’ọnọdu di na nwunye na ndi di-ha nwuru, Ọ diri ha nma ma asi na ha nānọgide dika mu onwem nọ kwa.

9 Ma ọ buru na ha apughi ijide onwe-ha, ka ha luru: n’ihi na ilu di na nwunye ka ire ọku n’agu aru nma.

10 Ma enyem ndi nọ n’ọnọdu di na nwunye iwu, ọ bughi mu onwem, kama ọ bu Onye-nwe-ayi, Ka nwunye ghara ikewapu onwe-ya n’aru di-ya

11 (ma asi na ọ bu ezie na ọ kewapuru onwe-ya, ya nọgide nēnweghi di; ma ọ meghi otú a, ka eme ka ya na di-ya di n’otù); ka di ghara kwa irapu nwunye-ya.

12 Ma ọ bu mu onwem, ọ bughi Onye-nwe-ayi, nāsi ndi fọduru: Ọ buru na nwa-nna ọ bula nwere nwunye nēkweghi ekwe, ọ buru kwa na ọ di nwanyi ahu ezi nma ka ya na ya biri, ka di-ya ghara irapu ya.

13 Ọzọ, nwanyi nke nwe di nēkweghi ekwe, ọ buru kwa na ọ di nwoke ahu ezi nma ka ya na ya biri, ka ọ ghara irapu di-ya.

14 N’ihi na edowo di nēkweghi ekwe nsọ nime nwunye-ya, edowo kwa nwunye nēkweghi ekwe nsọ nime nwa-nna-ayi nwoke: n’ihi na, ma ọ dighi otú a, umu-unu gābu umu nādighi ọcha; ma otú ọ di, ha di nsọ.

15 Ma ọ buru na onye ahu nke nēkweghi ekwe ekewapu onwe-ya, ya kewapu onwe-ya: emeghi ka nwa-nna-ayi nwoke ma-ọbu nwa-nna-ayi nwanyi buru orù n’okwu di otú a: ma Chineke akpọwo ayi n’udo.

16 N’ihi na ì si aṅa mara, nwunye, ma i gāzọputa di-gi? ma-ọbu ì si aṅa mara, di, ma i gāzọputa nwunye-gi.

17 Ọ bu nání, dika Onye-nwe-ayi kèworo nye onye ọ bula, dika Chineke kpọworo onye ọ bula, ya jegharia otú a. Otú a ka m’nāka kwa àkà nime nzukọ Kraist nile.

18 Àkpọrọ onye ọ bula mb͕e ebìsiri ya úgwù? ya ghara ighọ onye anēbìghi úgwù. Àkpọworo onye ọ bula n’ebìghi-úgwù? ya ghara ikwe ka ebì ya úgwù.

19 Obibì-úgwù abughi ihe, ebìghi-úgwù abughi kwa ihe; kama ọ bu idebe ihe nile Chineke nyere n’iwu.

20 Onye ọ bula, nime ọkpukpọ ahu eji kpọ ya, ya nọgide n’ọkpukpọ ahu.

21 Àkpọrọ gi mb͕e i bu orù? ya eb͕ula gi nb͕u n’obi: ma ọ buru kwa na i puru inwe onwe-gi, kari nke ahu were ya me ihe.

22 N’ihi na onye akpọrọ nime Onye-nwe-ayi, mb͕e ọ bu orù, ọ bu onye Onye-nwe-ayi mere ka o nwere onwe-ya: otú a onye akpọrọ, mb͕e o nwere onwe-ya, ọ bu orù Kraist.

23 Ewere ọnu-ahia b͕ara unu; unu aghọla ndi-orù madu.

24 Umu-nnam, onye ọ bula, nime ọnọdu nke akpọrọ ya, ya nọgide n’ọnọdu ahu n’ebe Chineke nọ.

25 Ma enweghi m ihe Onye-nwe-ayi nyere n’iwu bayere umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke: ma enyem ìzùm, dika onye Onye-nwe-ayi meworo ebere ka m’buru onye kwesiri ntukwasi-obi.

26 Ya mere, anamechè na nka di nma n’ihi nkpà di ub͕u a, bù, na ọ di nma ka madu di otú ọ di.

27 Ékekọwo gi na nwunye? achọla ntọpu. Àtọpuwo gi n’aru nwunye? achọla nwunye.

28 Ma asi kwa na ọ bu ezie na i luru nwunye, i mehieghi; asi kwa na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke lakuru di, o mehieghi. Otú ọ di, ndi di otú a gēnwe nkpab͕u n’anu-aru-ha: ma mu onwem nēmere unu ebere.

29 Ma nka ka m’nēkwu, umu-nnam, emewo ka oge a di nkpunkpu, ka ndi nwere nwunye we di ka ha enweghi site n’ub͕u a;

30 ka ndi nākwa ákwá we di ka ha akwaghi; ka ndi nāṅuri ọṅu we di ka ha aṅurighi; ka ndi nāzu ahia we di ka ha enweghi ihe;

31 ka ndi nēji uwa me ihe we di ka ha ejibigaghi ya ókè: n’ihi na uwa nka ka esi ahu ya anya nāgabiga agabiga.

32 Ma anamachọ ka unu buru ndi nādighi-echeb͕u onwe-unu. Onye nēnweghi nwunye nēcheb͕u onwe-ya n’ihe nke Onye-nwe-ayi, otú ọ gēme ihe gātọ Onye-nwe-ayi utọ:

33 ma onye nwere nwunye nēcheb͕u onwe-ya n’ihe uwa, otú ọ gēme ihe gātọ nwunye-ya utọ.

34 Akpawo kwa ókè n’etiti nwunye na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Nwanyi nke nēnweghi di nēcheb͕u onwe-ya n’ihe nke Onye-nwe-ayi, ka o we di nsọ n’aru-ya na mọ-ya kwa: ma nwanyi nke nwere di nēcheb͕u onwe-ya n’ihe nke uwa, otú ọ gēme ihe gātọ di-ya utọ.

35 Ma nka ka m’nēkwu ka ọ bara unu onwe-unu urù; ọ bughi ka m’fekwasi ihe-ntuhi n’aru-unu, kama ka eme ihe kwesiri, ya na ka unu we nọdu n’iru Onye-nwe-ayi ghara inwe uche-nb͕asasi.

36 Ma ọ buru na onye ọ bula nēchè na ọ nēmeso nwa-ya, bú nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, ihe nādighi nma n’anya, ma asi na ọ gabigawo oge inwe di, asi kwa na ọ di nkpà ime otú a, ya me ihe ọ nāchọ; o mehieghi; ka ha lua di na nwunye.

37 Ma onye nēguzosi ike n’obi-ya, ebe nkpà nākpaghi ya, kama o nwere ike ime ihe ya onwe-ya nāchọ, o zubewo kwa nka n’obi nke onwe-ya, idebe nwa-ya, bú nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, ọ gēme nke-ọma.

38 Ya mere onye nēnye nwa-ya n’ọlulu-di, bú nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, nēme nke-ọma; onye nēnyeghi ya n’ọlulu-di gēme kwa nke-ọma kari.

39 Ekewo nwunye n’aru di-ya ka oge di-ya nọ na ndu ra; ma asi na di-ya adawo n’ura ọnwu, o nwere onwe-ya ilu di ọ nāchọ; ma ọ bu nání nime Onye-nwe-ayi.

40 Ma ngọzi dikariri ya ma asi na ọ nọgidere otú ọ di, dika ìzùm si di: ma anamechè na mu onwem nwe-kwa-ra Mọ Chineke.

Categories
I. NDI KỌRINT

I. NDI KỌRINT 8

1 Ma okwu bayere ihe achuru n’àjà nye arusi: Ayi matara na ayi nile nwere ọmuma-ihe. Ọmuma-ihe nāfuli elu, ma ihu-n’anya nēwuli elu dika ulo.

2 Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya mara ihe ọ bula, ọ kāmaghi dika ọ nāghaghi ima;

3 ma ọ buru na onye ọ bula nāhu Chineke n’anya, onye ahu ka Chineke mara.

4 Ya mere okwu bayere iri ihe achuru n’àjà nye arusi, ayi matara na ọ dighi arusi ọ bula bu ihe n’uwa, ayi mata-kwa-ra na ọ dighi Chineke ọzọ ma-ọbughi otù.

5 N’ihi na asi na ọ bu kwa ezie na ndi anākpọ chi di, ma ọ bu n’elu-igwe ma-ọbu n’elu uwa; dika ọtutu chi na ọtutu ndi-nwe-madu di;

6 ma n’ebe ayi nọ otù Chineke di, bú Nna, Onye ihe nile sitere na Ya, Onye ayi onwe-ayi di-kwa-ra Ya; otù Onye-nwe-ayi di kwa, bú Jisus Kraist, Onye ihe nile sitere n’aka-Ya, ayi onwe-ayi site-kwa-ra n’aka-Ya.

7 Otú ọ di ọ bughi nime madu nile ka ọmuma-ihe ahu di: kama ufọdu, ebe arusi bu ihe anēme n’ala-ha rue ub͕u a, ha nēri ihe ahu dika ihe achuru n’àjà nye arusi; anēmeru kwa akọ-na-uche-ha, ebe ọ nādighi ike.

8 Ma ihe-oriri agaghi-eche ayi n’iru Chineke: ma asi na ayi erighi, ọ dighi ihe fọduru ayi inwe; ma asi kwa na ayi nēri, ayi ababigaghi ókè.

9 Ma lezienu anya ka ike-unu nka ghara isi n’uzọ ọ bula ghọ ihe gēme ka ndi nādighi ike su ngọngọ.

10 N’ihi na asi na onye ọ bula ahú gi, bú onye nwere ihe-ọmuma, ka i nānọdu na nri nime ulo arusi, akọ-na-uche-ya, ma ọ buru na ọ dighi ike, àgaghi-ewuli ya elu dika ulo iri ihe achuru n’àjà nye arusi?

11 N’ihi na site n’ihe-ọmuma-gi onye ahu nke nādighi ike nāla n’iyì, bú nwa-nna-gi nke Kraist nwuru n’ihi ya.

12 Ma otú a, mb͕e unu nēmehie megide umu-nna-unu, nētib͕u kwa akọ-na-uche-ha mb͕e ọ nādighi ike, unu nēmehie megide Kraist.

13 N’ihi nka, ma ọ buru na ihe-oriri eme ka nwa-nnam ma n’ọnyà, m’gaghi-eri anu ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi, ka m’ghara ime ka nwa-nnam ma n’ọnyà.