Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 23

1 Pọl we legide nnọkọ-ikpé ahu anya, si Umu-nnam, mu onwem ewerewo ezi akọ-na-uche nile biri n’iru Chineke dika onye-Ju rue ubọchi ta.

2 Onye-isi-nchu-àjà, bú Ananaias, we gwa ndi guzoro ya nso ka ha tie ya aka n’ọnu.

3 Mb͕e ahu Pọl siri ya, Chineke gaje iti gi aka, gi mb͕idi etere nzu: gì onwe-gi nānọdu kwa ala ikpem ikpé dika iwu-ayi si di, i we kwue ka etiem aka n’uzọ megidere iwu ahu?

4 Ndi guzoro nso we si, Ì nēkwutọ onye-isi-nchu-àjà nke Chineke?

5 Pọl we si, Amataghm, umu-nnem, na ọ bu onye-isi-nchu-àjà: n’ihi na edewo ya n’akwukwọ nsọ, si, Ekwula okwu ọjọ megide onye-isi ọ bula nke ndi nke gi.

6 Ma mb͕e Pọl matara na otù uzọ nime ha bu ndi-Sadusi, ma uzọ nke-ọzọ bu ndi-Farisi, o tiri nkpu nime nnọkọ-ikpe ahu, si, Umu-nnem, mu onwem bu onye-Farisi, nwa ndi-Farisi: anēkpe mu onwem ikpé bayere olile-anya na nbilite-n’ọnwu nke ndi nwuru anwu.

7 Mb͕e o kwusiri okwu a, esem-okwu we puta n’etiti ndi-Farisi na ndi-Sadusi: ọra ndi ahu we kewa.

8 N’ihi na ndi-Sadusi nāsi na nbilite-n’ọnwu, ma-ọbu mọ-ozi, ma-ọbu mọ, adigh: ma ndi-Farisi nēkwuputa ha abua.

9 Oké iti-nkpu we puta: ufọdu n’etiti ndi-ode-akwukwọ ndi di n’akuku ndi-Farisi we guzo ọtọ, lu kwa ọ̀gù, si, Ayi ahughi ihe ọjọ n’aru nwoke a: ma gini kwa ma ọ buru na mọ ma-ọbu mọ-ozi gwara ya okwu?

10 Mb͕e oké esem-okwu putara, onye-isi-ọchi-agha, ebe ọ nātu egwu na ha gādọkasi Pọl ma eleghi anya, o we gwa ndi-agha ka ha rida napu ya n’ike n’etiti ha, kuta ya n’ulo ndi-agha.

11 Ma n’abali soni Onye-nwe-ayi guzoro n’akuku ya, si, Nwe obi-ike: n’ihi na dika i kwuru okwu bayerem si-ike na Jerusalem, i ghaghi ib͕a kwa àmà otú a na Rom.

12 Mb͕e chi-ya bọrọ, ndi-Ju ufọdu we kekọta onwe-ha n’otù, me kwa onwe-ha ka ha buru anathema, si na ha agaghi-eri ihe ma-ọbu iṅu ihe rue mb͕e ha gēb͕uwori Pọl.

13 Ndi ṅukọrọ iyi a kariri ọgu ndikom abua.

14 Ndi ahu we biakute ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye, si, Ayi ji anathema me onwe-ayi ka ayi buru anathema, na ayi agaghi-edetu ihe ọ bula ọnu rue mb͕e ayi gēb͕uwori Pọl.

15 Ya mere ub͕u a unu onwe-unu na nnọkọ-ikpé-ayi gosi onye-isi-ọchi-agha ka o kuda ya biakute unu, dika unu gaje itule ihe bayere ya nke-ọma kari: ma ayi onwe-ayi bu ndi edoziworo ib͕u ya mb͕e ọ kābiarughi unu nso.

16 Ma nwa nke nwa-nne-nwanyi Pọl nuru na ha nēche inwude ya, o we bia ba n’ulo ndi-agha ahu, kọrọ Pọl.

17 Pọl we kpọtara onwe-ya otù onye nime ndi-ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, si, Duru nwa-okorọbia nka jekuru onye-isi-ọchi-agha: n’ihi na o nwere ihe ikọrọ ya.

18 Ya mere o kuru ya, duru ya jekuru onye-isi-ọchi-agha, si, Pọl onye-nkpọrọ kpọrọm jekuru ya, we kperem ka m’dutara gi okorọbia nka, ebe ọ nwere okwu igwa gi.

19 Onye-isi-ọchi-agha we jide ya n’aka, wezuga onwe-ya we jua ya iche, si Gini bu ihe i nwere ikọrọm?

20 Ọ si, Ndi-Ju kwekọrọ ọnu ikpere gi ka i kuda Pọl echi jekuru nnọkọ-ikpé-ha, dika i gaje ijuta ihe bayere ya nke-ọma kari.

21 Ya mere, gi onwe-gi ekweyela ha: n’ihi na ndikom kariri ọgu madu abua n’etiti ha nēche inwude ya, ndi mere onwe-ha ka ha buru anathema, si na ha agaghi-eri ihe ma-ọbu iṅu ihe rue mb͕e ha gēb͕uwori ya: ub͕u a ha edoziwo kwa onwe-ha, nēche nkwa i gēkwe ha.

22 Ya mere onye-isi-ọchi-agha zilagara nwa-okorọbia ahu, nēnye ya iwu, si, Agwala onye ọ bula na i gosirim ihe ndia.

23 O we kpọtara onwe-ya madu abua nime ndi-ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, si, Dozienu ọgu ndi-agha iri ka ha ga rue Sisaria, na ọgu ndi-inyinya atọ na iri, na ọgu ndi-agha iri nāchi ube, n’oge hour nke-atọ n’abali:

24 ọ gwa-kwa-ra ha ka ha chita anu-ulo, ka ha we dọkwasi Pọl n’elu ha, debe kwa ya nke-ọma rue mb͕e ha gābiakute Filiks, bú onye-isi.

25 O we de akwukwọ-ozi nke yiri nka:

26 Klọdiọs Lisias nēdegara Filiks, bú onye-isi di oké ebube, akwukwọ, nēkele ya.

27 Ndi-Ju jidere nwoke a, ha gaje kwa ib͕u ya, mb͕e mu na ndi-agha biakwasiri ha, weputa ya n’aka-ha, ebe m’nutasiri na ọ bu onye Rom.

28 Ebe m’zubere imazu ihe mere ha ji bo ya ebubo, m’we kudata ya na nnọkọ-ikpé-ha:

29 onye m’huru na anēbo ya ebubo bayere ajuju di iche iche nke iwu-ha, ma o nweghi ihe eboro ya kwesiri ọnwu ma-ọbu ab͕u.

30 Ma mb͕e egosirim na agāb͕a ajọ ìzù megide nwoke a, ngwa ngwa m’we zitere gi ya, nye kwa ndi nēbo ya iwu ka ha kwugide ya okwu n’iru gi.

31 Ya mere ndi-agha, dika akara ha àkà, were Pọl, kuru ya rue Antipatris n’abali.

32 Ma n’echi-ya ha rapuru ndi-inyinya ka ha so ya je, ha we laghachi n’ulo ndi-agha:

33 mb͕e ndi ahu biaruru Sisaria, nye kwa onye-isi akwukwọ-ozi ahu, ha we che kwa Pọl n’iru ya.

34 Mb͕e ọ gusiri ya, ọ jua ajuju ala o si puta; mb͕e ọ jutara na ọ bu onye Silisia,

35 ọ si, M’gānuzu okwu-gi mb͕e ọ bula ndi boro gi ebubo gēru kwa ebe a: o we nye iwu ka edebe ya na Pritoriọm nke Herod.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 24

1 Mb͕e ubọchi ise gasiri onye-isi-nchu-àjà, bú Ananaias, we ridata, ya na ndi-okenye ufọdu, na otù onye-ọ̀kà-okwu, aha-ya bu Tatọlọs; ndi ahu we kọrọ onye-isi akukọ megide Pọl.

2 Mb͕e akpọrọ ya, Tatọlọs we malite ibo ya ebubo, si,

Ebe ayi sitere n’aka-gi nwe udo ri nne, ebe esite-kwa-ra n’ezi uche, nke i ji buru uzọ zube ihe, nēmeziri mba nka ihe di iche iche,

3 ayi nānara ya nke-ọma n’uzọ nile na n’ebe nile, Filiks onye di oké ebube, ayi ji ekele nile.

4 Ma, ka m’ghara ime ka ike gwu gi kari, ariọm i ka i were obi-ọma-gi nuru okwu ole-na-ole n’ọnu-ayi.

5 N’ihi na ayi huru nwoke a ka ọ nābu onye nēme ka ihe ọjọ ba uba, onye nākpali kwa madu n’etiti ndi-Ju nile n’elu-uwa dum madu bi ka ha bilie megide ndi-isi, buru kwa otù onye-isi nime irọ-òtù ndi Nazaret:

6 onye nwa-kwa-ra imeru ulo uku Chineke: onye ayi jide-kwa-ra:

7 Ma onye-isi-ọchi-agha, bú Lisias, biakwasiri ayi, we were aka ike naputa ya n’aka-ayi;

8 onye i gāpu imazu n’ọnu-ya okwu bayere ihe nile ndia, nke ayi onwe-ayi nēbo ya ebubo, mb͕e gi onwe-gi gēkpe ya ikpé.

9 Ndi-Ju we so kwa ya n’ebubo ahu nāsi na ihe ndia di otú a.

10 Mb͕e onye-isi ahu fesiri ya aka ikwu okwu, Pọl we za, si,

Ebe m’mara na i bu onye-ikpé nye mba nka ọtutu arọ gara aga, ewerem obi-utọ nāgọpu onwem:

11 ebe i puru imazu na ọ karighi ubọchi iri na abua site na mb͕e m’rigoro ikpọ isi ala nye Chineke na Jerusalem:

12 ha ahughm kwa ka m’nāgwa madu ọ bula okwu ma-ọbu ikpaliri ìgwè madu nime ulo uku Chineke, ma-ọbu nime ulo-nzukọ, ma-ọbu nime obodo.

13 Ha apughi kwa igosi gi ihe ha nēbom ebubo ub͕u a.

14 Ma nka ka m’kwuputara gi, na dika Uzọ ahu si di nke ha nākpọ irọ-òtù, ọ bu otú a ka m’nēkpere Chineke nke nna-ayi-hà, ebe m’kwere ihe nile nke di ka iwu-ayi si di, nke edewo-kwa-ra n’akwukwọ ndi-amuma:

15 n’ihi na enwerem olile-anya n’ebe Chineke nọ, nke ndia onwe-ha nēche kwa, na nbilite-n’ọnwu nke ndi ezi omume na nke ndi ajọ omume kwa gaje idi.

16 Nime nka ka m’nārughari kwa arum uka inwe akọ-na-uche nādighi-asu ngọngọ n’ebe Chineke na madu nọ mb͕e ọ bula.

17 Ma mb͕e ọtutu arọ gasiri abiarurum iluru mba nkem ọlu ebere, na iche onyinye di iche iche n’iru Chineke:

18 mb͕e m’nēme ihe ndia ha hurum n’ulo uku Chineke mb͕e m’mesiri onwem ka m’di ọcha, mu na ìgwè madu ma-ọbu itu-ùzù adigh: ma ndi-Ju ufọdu ndi si n’Esia bia

19 ndi aghaghi inọ n’ebe a n’iru gi, na ibom ebubo, ọ buru na ha nwere ihe ọ bula imegidem.

20 Ma-ọbu ka ndia onwe-ha kwue ajọ omume ọ bula ha huru, mb͕e m’guzoro n’iru nnọkọ-ikpé-ha,

21 ma-ọbughi n’ihi otù nkpu a, nke m’tiri mb͕e m’guzoro n’etiti ha, si, Ọ bu ikpé bayere nbilite-n’ọnwu nke ndi nwuru anwu ka anēkpe mu onwem n’iru unu ta.

22 Ma ebe Filiks matara ihe bayere Uzọ Jisus nke-ọma kari, ọ gwa ha ka ha chere, si, Mb͕e ọ bula onye-isi-ọchi-agha, bú Lisias, gāridata, m’gātule okwu-unu.

23 O we nye ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise iwu ka edebe ya, ka eme kwa ka ihe diri ya nfé; ka aghara kwa ib͕ochi onye ọ bula nime ndi nke aka ya ijere ya ozi.

24 Ma mb͕e ubọchi ufọdu gasiri Filiks biaruru, ya na Drusila, nwunye nke aka ya, onye bu nwanyi Ju, o we kpọta Pọl, we nu okwu-ya bayere okwukwe nime Kraist Jisus.

25 Mb͕e ọ nēkwu okwu bayere ezi omume, na imerū ihe okè, na ikpé ahu nke gaje ibia, Filiks we tua egwu, o we za, si, Ga nke gi n’oge a; mb͕e m’nwere oge m’gākpọ kwa gi.

26 O nēle kwa anya na Pọl gēnye ya ego: n’ihi ya ọ nākpọta kwa ya ọtutu mb͕e, ya na ya nākparita kwa uka.

27 Ma mb͕e arọ abua b͕azuru, Pọsiọs Festọs nọchiri ọnọdu Filiks; ebe ọ nāchọ inwe iru-ọma n’ebe ndi-Ju nọ, Filiks we rapu Pọl n’ab͕u.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 25

1 Ya mere Festọs, mb͕e ala ahu batasiri n’aka-ya, mb͕e ubọchi atọ gasiri o si na Sisaria rigoro Jerusalem.

2 Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-isi n’etiti ndi-Ju we kọrọ ya akukọ megide Pọl; ha riọkwa-ra ya,

3 nāchọ amara imegide ha, ka ọ kpọta ya na Jerusalem; ebe ha nēche anwu ib͕u ya n’uzọ.

4 Otú ọ di, Festọs zara, si na anēdebe Pọl na Sisaria, si kwa na ya onwe-ya gaje ilaghachi ọsọsọ.

5 Ọ si, Ya mere, ka ndi ji ike n’etiti unu som rida, ọ buru kwa na ọ di ihe ọ bula nwoke ahu mehiere, ka ha bo ya ebubo.

6 Mb͕e ọ nọsiri n’etiti ha ihe nākaghi ubọchi asatọ ma-ọbu ubọchi iri, ọ ridata na Sisaria; echi-ya o we nọdu n’oche-ikpé-ya, we si ka ekuta Pọl.

7 Mb͕e ọ biaruru, ndi-Ju ndi siworo na Jerusalem ridata we guzo ya buruburu, nēbo ya ọtutu ebubo di arọ́, nke ha nēnweghi ike igosi;

8 Pọl nāgọpu kwa onwe-ya, si, Emehieghm ma-ọli megide iwu ndi-Ju, ma-ọbu imegide ulo uku Chineke, ma-ọbu imegide Sisa.

9 Ma Festọs, ebe ọ nāchọ inwe iru-ọma n’ebe ndi-Ju nọ, ọ zara Pọl, si, Ì n’achọ irigoro Jerusalem, ka akpe gi ikpé banyere ihe ndia n’irum n’ebe ahu?

10 Ma Pọl siri, Anameguzo n’iru oche-ikpé nke Sisa, ebe aghaghi ikpem: emegideghm ndi-Ju ajọ omume ọ bula, dika gi onwe-gi mazu-kwa-ra nke-ọma.

11 Ya mere ọ buru na emem ajọ omume, ọ buru kwa na emewom ihe kwesiri ọnwu, ariọghm ib͕anari ọnwu: ma ọ buru na ọ dighi ihe bu ezi-okwu n’ebubo ndikom ndia nēbom, ọ dighi onye ọ bula puru iwerem nye ha n’amara. Ọ bu Sisa ka m’nākpọku.

12 Mb͕e ahu Festọs, mb͕e ya na nnọkọ-ikpé-ya b͕asiri ìzù, ọ zara, si, I kpọkuwo Sisa: ọ bu Sisa ka i gāgakuru.

13 Ma mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, Agripa, bú eze, na Banaisi ruru Sisaria, kele kwa Festọs.

14 Mb͕e ha nānọgide n’ebe ahu ọtutu ubọchi, Festọs we debe okwu bayere Pọl n’iru eze ahu, si, Otù nwoke di onye Filiks rapuworo n’ulo-nkpọrọ:

15 mb͕e m’nọ na Jerusalem, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju we gwam okwu bayere ya, nāriọ ka ama ya ikpé.

16 M’we za ha, si, na ọ bughi ọme-n’ala nke ndi Rom iwere amara rara madu ọ bula nye, ma ọ buru na onye anēbo ebubo ebughi uzọ nwe ndi nēbo ya n’iru ya, hu kwa uzọ igọpu onwe-ya n’ihe eboro ya.

17 Ya mere mb͕e ha biakọrọ n’otù n’ebe a, alaghm azu, ma ubọchi so ya m’nọduru n’oche-ikpé, si ka ekuta nwoke ahu.

18 Ma mb͕e ndi nēbo ya ebubo guzoro ọtọ, ha ejighi ihe ọ bula nime ihe ọjọ mu onwem chère we bo ya;

19 ma ha ji ajuju ufọdu megide ya bayere nsọpuru-chi nke aka ha, na ajuju bayere otù Jisus, Onye nwururi anwu, Onye Pọl nāsi na Ọ di ndu.

20 Ebe mu onwem nwere obi abua otú m’gāju ajuju bayere ihe ndia, m’we jua ma ọ chọrọ iga Jerusalem, ka ekpe kwa ya ikpé bayere ihe ndia n’ebe ahu.

21 Ma mb͕e Pọl kpọrọ ka edebe ya nye ntule Ọgustọs, m’we si ka edebe ya rue mb͕e m’gēziga ya jekuru Sisa.

22 Agripa we si Festọs, Ọ gādim nma ka mu onwem nuru kwa nwoke ahu. Ọ si, Echi ka i gānu ya.

23 Ya mere echi-ya, mb͕e Agripa biara, ya na Banaisi, n’oké ebube, bata kwa n’ulo ọnunu-okwu, ha na ndi-isi-ọchi-agha, na ndikom amara aha-ha n’obodo ahu, mb͕e Festọs kwuru ewe kuta Pọl.

24 Festọs we si, Eze Agripa, na ndikom nile ayi na unu nọ n’ebe a, unu ahuwo onye a, onye ọra ndi-Ju nile riọrọm aririọ bayere ya, ma na Jerusalem ma n’ebe a, nēti nkpu na ọ di nkpà ka ọ ghara idi ndu ọzọ.

25 Ma mu onwem huru na o meghi ihe ọ bula kwesiri ọnwu: ma mb͕e ya onwe-ya kpọkuru Ọgustọs, m’we kpebìe iziga ya.

26 Ma enweghm okwu di itukwasi obi bayere ya idegara onye-nwem. N’ihi ya ekuputaram ya n’iru unu, ma nke ka n’iru gi onwe-gi, Eze Agripa, ka, mb͕e ekpesiri ya ikpé, ka m’we nwe ihe m’gēde n’akwukwo.

27 N’ihi na ọ dim ka ọ bu ihe uche nādighi ya, n’iziga onye-nkpọrọ, ka m’ghara igosi kwa ihe eboro ya.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 26

1 Agripa we si Pọl, Ekwere ka i kwuere onwe-gi okwu. Mb͕e ahu Pọl setiri aka-ya, we gọpu onwe-ya, si:

2 Eze Agripa, agurum onwem n’onye ngọzi diri, na agajem igọpu onwem n’iru gi ta n’ebubo nile ndi-Ju nēbom:

3 nke ka ebe i mazuru ọme-n’ala nile na ajuju nile di n’etiti ndi-Ju: n’ihi ya ariọm i ka i were ogologo-ntachi-obi nurum.

4 Ya mere, ndi-Ju nile matara ibi-obim site na nwata, nke sitere na mbu di n’etiti mba nke akam, na nime Jerusalem;

5 ebe ha buru uzọ maram site na mbu, ọ buru na ha chọrọ ib͕a àmà, na adim ndu ka onye-Farisi dika irọ-òtù ahu si di nke nēdebezu iwu kari n’uzọ ikpere Chineke ayi.

6 Eguzo-kwa-ram n’ebe a ub͕u a, ebe anēkpem ikpé bayere olile-anya nkwa ahu nke Chineke kwere nna-ayi-hà;

7 bú nkwa nke ebo-ayi iri na abua nēle anya na ha gēru, site n’ikpere Chineke si-ike abali na ehihie. Ọ bu kwa olile-anya nka ka ndi-Ju nēbom ebubo bayere ya, eze!

8 Gini mere anātule ya n’ihe anāgaghi-ekwe n’etiti unu, ma ọ buru na Chineke nēme ka ndi nwuru anwu si n’onwu bilie?

9 N’ezie mu onwem chère n’obim, na aghaghm ime ọtutu ihe megide aha Jisus onye Nazaret.

10 Nke m’me-kwa-ra na Jerusalem: mu onwem mechibido-kwa-ra ọtutu ndi nsọ n’ulo-nkpọrọ, ebe m’natara ike site n’aka ndi-isi-nchu-àjà, mb͕e eb͕uru ha m’we kweye imegide ha.

11 Esite-kwa-ram n’ime ka ha hu ahuhu-nmehie ọtutu mb͕e n’ulo-nzukọ nile chọ uzọ ime ka ha kwulu Chineke; ebe anya nādighm nma gabiga ókè megide ha, m’we nēsob͕u ha we rue obodo di iche eche di n’azu ala-ayi.

12 N’ime ihe ndia mb͕e m’nāga Damaskọs, ebe m’natara ike na nkweye n’aka ndi-isi-nchu-àjà,

13 n’etiti ehihie, eze, ahurum n’uzọ ìhè sitere n’elu-igwe, kariri onwunwu anyanwu, ka ọ nēnwu mu na ndi sorom n’ije buruburu.

14 Mb͕e ayi nile dasiri n’ala, m’we nu otù olu ka ọ nāsim n’asusu Hibru, Sọl; Sọl, gini mere i nēsob͕um? ọ di ike ka i b͕a ndudu eji achu ehi ukwu.

15 Mu onwem we si, Ì bu onye, Onye-nwe-ayi? Onye-nwe-ayi we si, Mu onwem bu Jisus, Onye gi onwe-gi nēsob͕u.

16 Ma bilie, guzo kwa n’ukwu-gi: n’ihi na emere ka i hum anya ka M’we me ihe a, irọputa gi ka i buru onye nēje ozi na onye-àmà nke ihe i hurum nime ha, na nke ihe M’gēme ka i hum anya nime ha;

17 nēweputa gi n’aka ndi-Ju, na n’aka ndi mba ọzọ, ndi Mu onwem nēziga gi jekuru ha,

18 isaghe anya-ha, ka ha we si n’ọchichiri chigharia ba n’ìhè, si kwa n’ike Setan chigharikute Chineke, ka ha we nara nb͕aghara nmehie nile na ihe-nketa n’etiti ndi edoworo nsọ site n’ikwere na Mu.

19 Site n’ihe ndia, eze Agripa, abughm onye nādighi-ekweye ọhù ahu nke elu-igwe:

20 kama eburum uzọ kọrọ ndi bi na Damaskọs akukọ, kọ kwa na Jerusalem, na nime ala Judia nile, kọ-kwa-ra ndi mba ọzọ, ka ha chègharia chigharikute kwa Chineke, nālu ọlu kwesiri nchèghari.

21 Ọ bu n’ihi ihe ndia ka ndi-Ju jiderem n’ulo uku Chineke, we nwa ib͕um.

22 Ya mere ebe m’natara iye-aka ahu nke si n’ebe Chineke nọ puta, eguzowom rue ubọchi ta, nāgwasi madu nile ike, ma onye uku, nēkwughi ihe ọ bula kari ihe ndi-amuma na Moses kwuru na ha gaje ime;

23 na Kraist-ayi aghaghi ihu ahuhu, na Ọ gaje kwa iburu uzọ kwusara ma ndi-Ju ma ndi mba ọzọ ìhè, site na nbilite-n’ ọnwu nke ndi nwuru anwu.

24 Mb͕e ọ nāgọpu onwe-ya otú a, Festọs were oké olu si, Pọl, anya adighi gi nma; oké nmuta-akwukwọ-gi nēme gi ka i ghọ onye anya nādighi nma.

25 Ma Pọl siri, Abughm onye anya nādighi nma, Festọs onye di oké ebube; anamekwuwa okwu nke ezi-okwu na nke anya-udo.

26 N’ihi na eze mara ihe bayere ihe ndia, onye m’nāgwawa kwa okwu: n’ihi na emere ka m’kweye na ọ dighi ihe ọ bula n’ihe ndia ezonariri ya; n’ihi na emeghi ihe a na nkuku.

27 Eze Agripa, ì kwere ndi-amuma? amataram na i kwere.

28 Agripa we si Pọl, I nēji okwu ntà eme ka m’kweye ibu Kristian.

29 Pọl we si, Anamekpere Chineke ka, ma ọ bu n’iji okwu ntà ma-ọbu n’iji okwu uku, ọ bughi nání gi onwe-gi, kama ọ bu kwa ndi nile nānu olum ta, gāghọ aha madu mu onwem bu kwa, ma-ọbughi ab͕u ndia.

30 Eze we bilie, ya na onye-isi, na Banaisi, na ndi ha na ha nọduru:

31 mb͕e ha wezugasiri onwe-ha, we kwurita n’etiti onwe-ha, si; Nwoke a emeghi ihe ọ bula kwesiri ọnwu ma-ọbu ab͕u.

32 Agripa we si Festọs, Apuru irapu nwoke a ka ọ la, ma ọ buru na ọ kpọkughi Sisa.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 27

1 Mb͕e ekpebìri na ayi gābà n’ub͕ọ je Itali, ha we rara Pọl na ufọdu ndi-nkpọrọ ọzọ nye n’aka ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, aha-ya bu Juliọs, nke òtù ndi-agha Ọgustọs.

2 Ayi we ba n’ub͕ọ Adramitiọm, nke gaje iga ebe di n’usọ oké osimiri nke Esia, we nupu, Aristakọs, onye Masedọnia nke Tesalọnaika, soro kwa ayi.

3 Ubọchi soni ayi we rue ala na Saidon: Juliọs we were obi-ọma mezie Pọl, kwere ka o jekuru ndi-eyì-ya ka ewe le ya anya nke-ọma.

4 Ayi we si n’ebe ahu nupu ub͕ọ, we nāga ala Saiprọs nso, n’ihi na ifufe nēfegide ayi.

5 Mb͕e ayi gabigasiri oké osimiri nke di n’akuku Silisia na Pamfilia, ayi we rue Maira, obodo nke Lisia.

6 N’ebe ahu ka ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise huru ub͕ọ Aleksandria nke nēje Itali; o we me ka ayi ba nime ya.

7 Mb͕e ayi gasiri nwayọ ọtutu ubọchi, mb͕e ọ di kwa ayi ike iru na ncherita-iru Naidọs, ebe ifufe nēkweghi ka ayi ga n’iru ọzọ, ayi we nāga ala Krit nso, na ncherita-iru Salmoni;

8 o we di ayi ike iga n’akuku ya, ayi we rue otù ebe anākpọ Ọnu-miri Ọma; nke obodo Lasia di ya nso.

9 Ma mb͕e o ruru ọtutu oge, mb͕e ije-ub͕ọ di kwa egwu ub͕u a, n’ihi na ub͕u a ka oge Obubu-ọnu gasiri, Pọl we dọ ha aka na nti,

10 si ha, Ndikom, ahuwom na nbibi na oké iyì gaje idi n’ije-ub͕ọ a, ọ bughi nání nke ihe ub͕ọ nēbu na ub͕ọ onwe-ya, ma nke ndu-ayi kwa.

11 Ma ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise kweyere onye-isi ub͕ọ na onye nwe ub͕ọ, kari okwu Pọl kwuru.

12 Ebe ọnu-miri ahu nādighi n’ebe di nma inogide na mb͕e oyi, ndi ka n’ọnu-ọgugu nime ha we du ọdú ka enupu ub͕ọ n’ebe ahu, ma eleghi anya ha gēru Finiks, we nọgide n’ebe ahu na mb͕e oyi; nke bu otù ọnu-miri nke Krit, nke nēche iru n’Ọwuwa-anyanwu n’akuku Ugwu na akuku Ndida.

13 Mb͕e ifufe nēfe nwayọ, ebe ha chère na ihe ha nēzube eruwo ha aka, ha we pua nāga n’akuku Krit.

14 Ma mb͕e ogologo oge akāgaghi, oké ifufe jọb͕uru onwe-ya nke anākpọ Yurakwilo, we si n’ebe ahu fedata:

15 mb͕e ifufe ahu napuru ayi ub͕ọ, mb͕e ub͕ọ apughi kwa ichegide ifufe ahu, ayi we rapu aka, ewe nēfeghari ayi.

16 Ma ebe ayi b͕ara ọsọ rue agwe-etiti ntà nso anākpọ Klọda, ayi we nwe ike ijide ub͕ọ ntà ayi, ma ọ di ayi ike:

17 mb͕e ha dọlitesiri ya elu, ha we chiri udọ̀ ime ka ub͕ọ-ayi sie ike, nēkebiga ya n’okpuru: ebe ha nātu egwu na agātubà ha na Satis ma eleghi anya, ha we dọda ákwà-ifufe, ewe nēfeghari ha otú a.

18 Mb͕e ifufe nēfegidesi ayi ike, ubọchi soni ha we tufube ihe ub͕ọ nēbu;

19 n’ubọchi nke-atọ ha we were aka-ha kpofue ihe ub͕ọ.

20 Ma mb͕e ọ nādighi anyanwu ma-ọbu kpakpando nāmukwasi ayi ọtutu ubọchi, mb͕e ọ dighi kwa oké ifufe ntà nēfekwasi ayi, ewe wepu olile-anya nile na agāzọputa ayi site n’ub͕u a.

21 Mb͕e ha nọdusiri rue oge di anya nērighi ihe, mb͕e ahu Pọl we guzo n’etiti ha, si, Ndikom, o kwesiri ka unu kweyerem, ghara kwa inupu ub͕ọ na Krit, na inwe nbibi a na iyì a.

22 Ub͕u a adọkwam unu aka na nti ka unu nwere obi-utọ: n’ihi na ọ dighi ntufu gādi n’etiti unu, kama ọ bu ntufu nke ub͕ọ.

23 N’ihi na mọ-ozi nke Chineke ahu Onye nwem, Onye m’nēkpe-kwa-ra guzorom nso n’abali a,

24 si, Atula egwu, Pọl; i ghaghi iguzo n’iru Sisa: le kwa, Chineke ewerewo amara nye gi ndi nile gi na ha nānọ n’ub͕ọ.

25 N’ihi nka, ndikom, nwenu obi-utọ: n’ihi na ekwerem Chineke, na ọ gādi otú a ọbuná dika agwaworom.

26 Otú ọ di aghaghi itupu ayi n’elu otù agwe-etiti.

27 Ma mb͕e o ruru abali nke-iri-na-anọ, mb͕e ayi nērughari n’osimiri Adria, dika etiti abali ndi-ub͕ọ chère na ha nābiaru otù ala nso;

28 ha we tù oké osimiri, hu na ọ bu orú mbudu: mb͕e oge ntà gasiri, ha we tù ọzọ, hu mbudu iri na ise.

29 Ebe ha nātu egwu ma eleghi anya miri gātupu ayi n’ala nkume, ha we rada arilika anọ n’isi ub͕ọ, we kpe ekpere ka chi we bọ.

30 Mb͕e ndi-ub͕ọ nāchọ uzọ isi n’ub͕ọ b͕apu, mb͕e ha wedasi-kwa-ra ub͕ọ ntà n’oké osimiri, nēme dika ha gaje iseti arilika n’ọnu-ub͕ọ,

31 Pọl we si ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise na ndi-agha, Ọ buru na ndia anọgideghi n’ub͕ọ, apughi izọputa unu onwe-unu.

32 Mb͕e ahu ndi-agha bipuru udọ̀ ub͕ọ ntà ahu, we rapu ya ka ọ dapu.

33 Mb͕e chi gaje ibọ, Pọl we riọ ha nile ka ha rie nri, si Ta mere ya ubọchi nke-iri-na-anọ unu nēle anya, nọgide kwa n’ibū ọnu, ebe unu nērighi ihe.

34 N’ihi ya ariọm unu ka unu rie nri: n’ihi na nka diri nzọputa-unu: n’ihi na ọ dighi otù agiri-isi gēsi n’isi onye ọ bula n’etiti unu la n’iyì.

35 Mb͕e o kwusiri ihe ndia, nara kwa achicha, ọ kele Chineke n’iru madu nile: we nyawa ya, malite kwa iri ya.

36 Ha nile we nwe obi-utọ, ha onwe-ha we ri kwa nri.

37 Ayi nile ndi nọ n’ub͕ọ di ọgu madu iri-na-atọ na madu iri na isi.

38 Mb͕e ha rijusiri afọ, ha me ka ub͕ọ di nfé, site n’itufu ọka n’oké osimiri.

39 Ma mb͕e chi bọrọ, ha amataghi ala ahu: ma ha huru otù ọnu-miri nke nwere ótú, ha we b͕a ìzù ma ha puru ime ka miri nubà ub͕ọ n’ala.

40 Mb͕e ha tupusiri arilika nile, rapu kwa ha n’oké osimiri, ha we tọpu udọ̀ umara isi-ub͕ọ n’otù oge ahu; ha we dọlie ákwà-ifufe nke ọnu-ub͕ọ nye ifufe, we jebe n’ótú.

41 Ma ebe ha dabàra n’otù ebe di n’ab͕ata oké osimiri abua, ha we tiye ub͕ọ n’ala; ọnu-ub͕ọ we siri n’ala digide kwa nēnweghi ike ka eropu ya, ma ike ebili-miri nyajibere isi-ub͕ọ.

42 Ma ọdú ndi-agha duru bu ka ha b͕ue ndi-nkpọrọ, ka onye ọ bula nime ha ghara isi n’ub͕ọ gwu miri, we b͕alaga.

43 Ma ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise, ebe o nēzube izọputa Pọl, o b͕ochiri ha n’ìzù-ha; we si ka ndi puru igwu miri si n’ub͕ọ tubà onwe-ha na miri, buru uzọ rue ala:

44 ka ndi fọduru ru kwa, ufọdu n’elu ibo, ndi ọzọ n’elu ihe di iche iche si n’ub͕ọ puta. Otú a o we rue, na azọputara madu nile, ha we rue ala.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 28

1 Mb͕e azọputasiri ayi, mb͕e ahu ayi matara na anākpọ agwe-etiti ahu Melita.

2 Ndi bi n’ebe ahu, bú ndi nāsu asusu ọzọ, we were obi-ọma mezie ayi n’uzọ anāhughi mb͕e ọ bula: n’ihi na ha funwuru ọku, kpọbata ayi nile, n’ihi miri nke nēzo n’oge ahu, na n’ihi oyi.

3 Ma mb͕e Pọl chikọtasiri ùkwù nkù, tukwasi ha n’ọku, aju-ala we si n’okpom-ọku ahu puta, ta ya alu kokwasi kwa ya n’aka.

4 Mb͕e ndi ahu ndi nāsu asusu ọzọ huru anu-ọhia ahu ka o kokwasiri ya n’aka, ha we sirita ibe-ha, N’ezie nwoke a bu ob͕u-madu, onye ọ bu ezie na azọputara ya n’oké osimiri, ma Ikpé ziri ezi ekweghi ka ọ di ndu.

5 Otú ọ di, o febàra anu-ọhia ahu nime ọku, ma ọ dighi ihe ọjọ meruru ya aru.

6 Ma ha nēle anya na ọ gaje iza, ma-ọbu ida n’ala nwua na mberede: ma mb͕e ha nēle anya ogologo oge, ma ha ahughi ihe ọ bula jọrọ njọ mere ya, ha we chègharia uche-ha, si na ọ bu chi.

7 Ma n’ala di ab͕ata ebe ahu onye-isi agwe-etiti ahu, aha-ya bu Pọbliọs, nwere iberibe ala ufọdu; onye nara ayi nke-ọma, were kwa obi-ọma le ayi ọbìa ubọchi atọ.

8 O we rue, na nna Pọbliọs nēdina, aru-ọku na ọnyunyu-ọbara jidesiri ya ike: onye Pọl bakutere, we kpe ekpere, bikwasi ya aka abua me ka aru di ya ike.

9 Mb͕e emere nka, ndi fọduru n’agwe-etiti ahu ndi nāria nriaria we biakute ya, ewe me ka aru-ha di ike:

10 ha we were kwa ọtutu nsọpuru sọpuru ayi; mb͕e ayi nupuru ub͕ọ, ha we tiye n’ub͕ọ ihe nile di ayi nkpà.

11 Mb͕e ọnwa atọ gasiri ayi we ba n’ub͕ọ Aleksandria nupu, bú ub͕ọ nke nọgidereri n’agwe-etiti ahu na mb͕e oyi, nke ihe-iriba-ama-ya bu, Umu-nne-ndikom abua amuru n’otù mb͕e.

12 Ayi we rue ala na Sairakus, we nọgide n’ebe ahu ubọchi atọ.

13 Ayi we site n’ebe ahu ga buruburu, we rue Rijiọm: mb͕e otù ubọchi gasiri ifufe Ndida we febe, n’ubọchi nke-abua ayi we bia rue Pọtiọli:

14 ebe ayi huru umu-nna nime Kraist, ewe riọ ayi ka ayi na ha nọgide ubọchi asa: otú a ayi we bia rue Rom.

15 Umu-nna-ayi nime Kraist, mb͕e ha nuru ihe bayere ayi, ha we bia izute ayi rue Ahia Apiọs, na Ulo-ndi-ije Atọ: mb͕e Pọl huru ha, o kele Chineke, nwe kwa obi-ike.

16 Mb͕e ayi batara nime Rom, ewe kwe ka Pọl nọgide iche, ya na onye-agha nke nēche ya.

17 O rue, na mb͕e ubọchi atọ gasiri ọ kpọkọrọ ndi bu ndi-isi n’etiti ndi-Ju: mb͕e ha biakọrọ n’otù, ọ si ha, Umu-nnem, mu onwem, ọ bu ezie na emeghm ihe ọ bula megide ndi-Ju, ma-ọbu ọme-n’ala nke nna-ayi-hà, ma esi na Jerusalem raram nye n’aka ndi Rom ka m’buru onye-nkpọrọ:

18 ma ndi ahu, mb͕e ha kpesirim ikpé, ha zubere irapum ka m’la, n’ihi na ọ dighi ihe kwesiri onwu dim n’aru.

19 Ma mb͕e ndi-Ju kwugidere ya, erugiderem ka m’kpọkue Sisa; ọ bughi na enwerem ihe ibo mba nkem ebubo.

20 Ya mere n’ihi ihe nka ka m’riọrọ unu ka m’hu unu anya gwa kwa unu okwu: n’ihi na ọ bu n’ihi olile-anya nke Israel ka ekerem nkpọrọ a

21 Ha we si ya, Ayi onwe-ayi anataghi akwukwọ-ozi site na Judia bayere gi, ọ dighi kwa onye ọ bula n’etiti umu-nne-ayi ruru ebe a, we kọ akukọ ma-ọbu kwue ajọ ihe ọ bula bayere gi.

22 Ma ọ di ayi nma inu n’ọnu-gi ihe i tukwasiri uche-gi na ha: n’ihi na ihe bayere irọ-òtù a, ayi mazuru na anēkwugide ya ebe nile.

23 Mb͕e ha kasiri ya otù ubọchi àkà, ọtutu madu kariri we biakute ya n’ebe ọ nọ dika ọbìa; ndi ọ kọrọ akukọ, nēkwusi okwu ala-eze Chineke ike, nēme kwa ka ha kweye n’ihe bayere Jisus, site n’iwu Moses, site kwa na ndi-amuma, si n’ututu rue anyasi.

24 Ufọdu we kwere ihe nile ekwuru, ma ufọdu ekweghi.

25 Mb͕e ha nēnweghi otù olu n’etiti onwe-ha, ha we la, mb͕e Pọl kwusiri otù okwu, si, Mọ Nsọ we site n’ọnu Aisaia onye-amuma gwa nna-unu-hà okwu nke-ọma,

26 si,

Jekuru ndi nka, si,

N’ọnunu unu gānu, ma unu agaghi-anuta ma-ọli;

N’ọhuhu unu gāhu, ma unu agaghi-ahuta ma-ọli:

27 N’ihi na obi ndi nka mara abuba,

Nti-ha kpọchi-kwa-ra,

Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha;

Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ ma eleghi anya,

Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe,

Ghara kwa iwere obi-ha ghọta,

Ghara kwa ichighari,

Ka M’ghara kwa ime ka aru di ha ike.

28 Ya mere maranu, na nzọputa nka, bú nke Chineke, ka ezigara ndi mba ọzọ: ndi ahu gānu kwa.

29 Mgbe o kwusiri okwu ndia, ndi-Ju we pua, rurita uka nke-uku n’etiti onwe-ha.

30 O we nọgide arọ abua dum n’ulo nke aka ya o goro ego, nānara kwa ndi nile bakutere ya,

31 nēkwusa ala-eze Chineke, nēwere kwa nkwuwa-okwu nile zí ihe nile bayere Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ọ dighi onye nēb͕ochi ya.

Categories
NDI ROM

NDI ROM 1

1 Pọl, orù nke Jisus Kraist, onye akpọrọ ibu onye-ozi, onye ekewapuru nye ozi ọma Chineke,

2 nke O buru uzọ kwere na nkwa site n’ọnu ndi-amuma-Ya n’ihe nile edeworo n’akwukwọ nsọ,

3 bayere Okpara-Ya, Onye amuru site na nkpuru Devid dika anu-aru si di,

4 Onye akaworo ibu Ọkpara Chineke n’ike, dika Mọ nke idi-nsọ si di, site na nbilite-n’ọnwu nke ndi nwuru anwu; bú Jisus Kraist Onye-nwe-ayi,

5 Onye ayi sitere n’aka-Ya nata amara na ọlu onye-ozi, rue iṅa-nti nke okwukwe n’etiti mba nile, n’ihi aha-Ya:

6 ndi unu onwe-unu nọ kwa n’etiti ha, ndi akpọrọ ibu ndi nke Jisus Kraist:

7 Pọl nka nēdegara ndi nile nọ na Rom akwukwọ, bú ndi Chineke huru n’anya, ndi akpọrọ ibu ndi nsọ: Amara diri unu na udo nke si n’aka Chineke Nna-ayi na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist bia.

8 Mbu, anamekele Chinekem ekele site na Jisus Kraist bayere unu nile, na anēkwusa okwukwe-unu n’uwa dum.

9 N’ihi na Chineke, Onye m’nēkpere nime mọm n’ozi ọma nke Ọkpara-Ya, bu Onye-àmàm, otú m’nārapughi aka n’ihota unu,

10 nāriọ aririọ mb͕e nile n’ekperem nile, ọ buru na, ma eleghi anya, ub͕u a n’oge a ezi uzọ gādirim ibiakute unu, n’ihe Chineke nāchọ.

11 N’ihi na ihu unu anya nāgusim ike, ka m’kwe ka unu keta onyinye-amara ufọdu nke Mọ Nsọ, ka ewe me ka unu guzosie ike;

12 nke ahu bu, ka ewe kasie mu na unu obi n’etiti unu, site n’okwukwe ayi kwekọrọ, ma nke unu ma nke mu onwem.

13 Ma achọghi m ka unu ghara imara, umu-nnam, na ọtutu mb͕e m’zubere ibiakute unu (eb͕ochi-kwa-ram ibia rue ub͕u a), ka m’we nwe kwa nkpuru ufọdu n’etiti unu, dika ọ di kwa n’etiti ndi mba ọzọ fọduru.

14 Ejim madu nile ugwọ, ma ndi-Grik ma ndi nāsu asusu ọzọ, ma ndi mara ihe ma ndi nēnweghi uche.

15 Otú a, ka ihe bayere mu onwem ra, ọ dim ọku n’obi izì kwa unu ndi bi na Rom ozi ọma.

16 N’ihi na ihere ozi ọma ahu adighi-emem: n’ihi na ọ bu ike nke Chineke rue nzọputa nye onye ọ bula nke kwere; onye-Ju na mbu, na onye-Grik kwa.

17 N’ihi na anēkpughe ezi omume Chineke nime ya, site n’okwukwe rue okwukwe: dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si, Ma onye ezi omume gēsite n’okwukwe di ndu.

18 N’ihi na esi n’elu-igwe kpughe iwe Chineke imegide asọpurughi-Chineke na ajọ omume nile nke madu, ndi nēb͕ochi ezi-okwu n’ajọ omume;

19 n’ihi na ihe apuru imata bayere Chineke nāputa ìhè nime ha; n’ihi na Chineke mere ka ọ putara ha ìhè.

20 N’ihi na ihe-Ya anya nāhughi site n’òkìkè uwa ka anāhu nke-ọma, ebe anāghọta ha site n’ihe nile ekère èkè, bú ike ebighi-ebi Ya na udi-Chineke-Ya; ka ha ghara inwe ngọpu:

21 n’ihi na, ọ bu ezie na ha mara Chineke, ma ha enyeghi Ya otuto dika Chineke, ha ekeleghi kwa Ya; kama emere ha ihe-efu n’ihe nile ha nātule n’obi-ha, obi-ha nke nēnweghi nghọta b͕a-kwa-ra ọchichiri.

22 Mb͕e ha nēkwu na ha bu ndi mara ihe, ha we ghọ ndi-nzuzu,

23 we were ebube nke Chineke anāpughi imebi b͕anwere oyiyi nke onyinyo madu apuru imebi, na nke anu-ufe na anu ukwu anọ na ihe nākpu akpu di iche iche.

24 N’ihi ya Chineke rara ha nye n’aka adighi-ọcha n’ihe ọjọ nile nāgu obi-ha, ka ewe me aru-ha ihe-ihere n’etiti ha:

25 ebe ha were ezi-okwu nke Chineke b͕anwere ugha-ha, ha we sọpuru nēkpe-kwa-ra ihe ekère èkè kama Onye kère èkè, Onye agọziworo ebighi-ebi. Amen.

26 N’ihi nka Chineke rara ha nye n’aka agu ihe-ihere: n’ihi na ndinyom-ha were nwanyi ha bu site n’ọmumu b͕anwere ihe nēmegide ka esi mu ha:

27 otú a ndikom rapu-kwa-ra otú anēme nwanyi site ka esi mu ya, we re ọku n’agu-ha n’aru ndikom-ibe-ha, ndikom nāluputa ihe nādighi nma n’anya n’aru ndikom, nānara kwa nime onwe-ha ugwọ-ọlu ahu nke njehie-ha nke ha nāghaghi inara.

28 Dika ha juru inọgide n’imazu Chineke, Chineke ra-kwa-ra ha nye n’aka uche ajuru aju, ime ihe ahu nile nēkwesighi;

29 ebe ha juputara n’ajọ omume nile, ajọ ọlu, anya-uku, obi ọjọ; juputa kwa n’ekworo, ob͕ub͕u-madu, esem-okwu, aghughọ, uche ọjọ; ndi-ntakwu,

30 ndi nēkwutọ madu, ndi nākpọ Chineke asì, ndi nēme madu ihe-ihere, ndi-npako, ndi nānya isi, ndi nāchọputa ihe ọjọ, ndi nēkweyeghi ndi muru ha,

31 Ndi nēnweghi nghọta, ndi nēmebi ọb͕ub͕a-ndu, ndi ihe madu-ibe-ha nādighi-atọ utọ, ndi nēnweghi obi-ebere:

32 madu ndi, ọ bu ezie na ha mazuru ihe Chineke guru n’ihe ziri ezi, na ndi nēme ihe di otú a kwesiri ọnwu, ma ọ bughi nání na ha nēme ha, kama ndi nēme ha di kwa ha ezi nma.

Categories
NDI ROM

NDI ROM 2

1 N’ihi ya i nweghi ngọpu, gi madu, onye ọ bula nēkpe ikpé: n’ihi na i nāma onwe-gi ikpe n’ihe i nēkpe madu-ibe-gi; n’ihi na gi onye nēkpe ikpe nēme otù ihe ahu.

2 Ayi ma-kwa-ra na ikpé Chineke di ka ezi-okwu si di imegide ndi nēme ihe di otú a.

3 Ma ì nāgu nka, gi madu, nke nēkpe ndi nēme ihe di otú a, ma i nēme kwa ha, na gi onwe-gi gāb͕anari ikpé Chineke?

4 Ma-ọbu ì nēlelì àkù nke obi-ọma-Ya na nke nnagide-Ya na nke ogologo-ntachi-obi-Ya, ebe i nāmaghi na ọlu obi-ọma Chineke nēdubà gi na nchèghari?

5 ma dika obi-etili-gi na obi-gi nēchègharighi si di i nākpado iwe nye onwe-gi n’ubọchi iwe na nkpughe nke ikpé ziri ezi nke Chineke;

6 Onye gēnyeghachi onye ọ bula dika ọlu-ya nile si di:

7 ndi site na ntachi-obi n’ezi ọlu nāchọ otuto na nsọpuru na apughi-imebi ka Ọ gēnye ndu ebighi-ebi:

8 ma ndi di n’akuku nke ikpa-iche-iche, ndi nēkweyeghi kwa ezi-okwu, kama ha nēkweye ajọ omume, iwe na ọnuma,

9 nkpab͕u na oké nkpà, gādiri ha, n’elu nkpuru-obi ọ bula nke madu onye nāluputa ihe ọjọ, nke onye-Ju na mbu, na nke onye-Grik kwa;

10 ma otuto na nsọpuru na udo gādiri onye ọ bula nke nālu ezi ọlu, onye-Ju na mbu, na onye-Grik kwa:

11 n’ihi na ile-madu-anya-n’iru adighi n’ebe Chineke nọ.

12 N’ihi na ka ha ra, bú ndi mehiere nēnweghi iwu, ha gāla kwa n’iyì nēnweghi iwu: ka ha ra kwa, bú ndi mehiere n’okpuru iwu, agēsite n’iwu kpe ha ikpé;

13 n’ihi na ọ bughi ndi nānu iwu bu ndi ezi omume n’ebe Chineke nọ, kama ọ bu ndi nēdebe iwu ka agāgu na ndi ezi omume:

14 n’ihi na mb͕e ọ bula ndi mba ọzọ ndi nēnweghi iwu nēme ihe nile di n’iwu site ka esi mu ha, ndi ahu, ọ bu ezie na ha enweghi iwu, ma ha onwe-ha bu iwu enyere onwe-ha;

15 n’ihi na ha nēgosi ọlu iwu na edewo ya n’obi-ha, akọ-na-uche-ha nēso kwa ya nāb͕a àmà, ihe ha nātule n’obi-ha n’etiti onwe-ha nēbo kwa ha ebubo ma-ọbu ma eleghi anya nāgọpu ha;

16 n’ubọchi ahu mb͕e Chineke gēkpe ihe-nzuzo nile nke madu nile, dika ozi ọma m si di, site n’aka Jisus Kraist.

17 Ma ọ buru na akpọrọ gi onwe-gi aha onye-Ju, ọ buru kwa na i nēzu ike n’elu iwu, nānya kwa isi na Chineke,

18 nāma kwa ihe Ọ nāchọ, nānwa kwa ihe ha na ibe-ha di iche, ebe anēwere okwu-ọnu zí gi ihe site n’iwu-gi,

19 ọ buru kwa na eme ka i kweye na gi onwe-gi bu onye-ndú nke ndi-ìsì, ìhè nke ndi nọ n’ọchichiri,

20 onye nāzùputa ndi nēnweghi uche, onye-ozizí nke umu ọhu, ebe i nēnwe udi nke ihe-ọmuma na nke ezi-okwu n’iwu ahu;

21 ya mere gi onye nēzí madu-ibe-gi ihe, ì dighi-ezí onwe-gi? gi onye nēkwusa ka madu ghara izu ori, ì nēzu ori?

22 gi onye nāsi ka madu ghara ikwa iko, ì nākwa iko? gi onye nākpọ arusi ihe-árú, ì nēzu ihe ulo chi ori?

23 gi onye nānya isi n’iwu, ì nēme Chineke ihe-ihere site na njehie-gi n’iwu ahu?

24 N’ihi na anēkwulu aha Chineke n’etiti ndi mba ọzọ n’ihi unu, dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ.

25 N’ihi na obibì-úgwù nāba urù ezie, ma ọ buru na i nēdebe iwu: ma ọ buru na i bu onye-njehie n’iwu, obibì-úgwù-gi aghọwo ebìghi-úgwù.

26 Ya mere ọ buru na onye ebìghi-úgwù nēdebe ihe nile iwu-gi guru n’ihe ziri ezi, àgaghi-agu ebìghi-úgwù-ya n’obibì-úgwù?

27 onye ebìghi-úgwù ka esi mu ya, ma ọ buru na ọ debezu iwu, ọ̀ gaghi-ekpe kwa gi ikpé, onye sitere n’ihe edeworo n’akwukwọ na obibì-úgwù bu onye-njehie n’iwu?

28 N’ihi na onye nke bu onye-Ju n’anya madu abughi onye-Ju; obibì-úgwù ahu nke madu nāhu anya, nke di n’anu-aru, abughi kwa obibì-úgwù:

29 kama onye nke bu onye-Ju n’ihe zoro ezo, onye ahu bu onye-Ju; obibì-úgwù bu kwa nke nkpuru-obi, nime mọ, ọ bughi n’ihe edeworo n’akwukwọ; nke otuto-ya nēsiteghi n’aka madu, kama o sitere n’aka Chineke.

Categories
NDI ROM

NDI ROM 3

1 Gini kwa ka onye-Ju nwebigara ókè? ma-ọbu ùrù gini ka ibì-úgwù bara?

2 Ọ bara urù ri nne n’uzọ nile: mbu, na ewere okwu si n’ọnu Chineke puta nye ha n’aka na ntukwasi-obi.

3 N’ihi na asi na ufọdu ekweghi, gini kwa? èkweghi-ekwe-ha gēme ka ikwesi-ntukwasi-obi nke Chineke ghara idi irè?

4 Chineke ekwela: kama ka ọ puta ihè na Chineke bu Onye ezi-okwu, ma madu nile n’otù n’otù bu ndi-ugha; dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si,

Ka ewe gua Gi n’onye ezi omume n’okwu-Gi nile,

Ka I we kpeb͕u kwa mb͕e anēkpe Gi ikpé.

5 Ma ọ buru na ajọ omume-ayi eme ka ezi omume Chineke puta ìhè, gini ka ayi gēkwu? Chineke, Onye nēme ka iwe-Ya dakwasi ayi, Ọ̀ bu onye ajọ omume? (Anamekwu dika madu.)

6 Chineke ekwela: n’ihi na Chineke gēsi kwa aṅa kpe uwa ikpé?

7 Ma ọ buru na ezi-okwu nke Chineke babigara uba ókè n’iwetara Ya ebube site n’okwu-ugha nkem, gini mere anēkpe kwa mu onwem ikpé ọzọ dika onye-nmehie?

8 gini me-kwa-ra ayi asighi, Ka ayi me ihe ọjọ, ka ezi ihe we puta? (dika anēkwulu ayi, dika ufọdu nēkwu kwa na ayi nāsi), ndi ikpé-ha ziri ezi.

9 Gini kwa? àyi ka ha nma? É-è, ayi akaghi ha nma ma-ọli: n’ihi na ayi buru uzọ bo ndi-Ju bo kwa ndi-Grik ebubo, na ha nile nọ n’okpuru nmehie;

10 dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si,

Ọ dighi onye bu onye ezi omume, ọ dighi otù onye ma-ọli;

11 Ọ dighi onye nāghọta,

Ọ dighi onye nāchọ Chineke;

12 Ha nile ewezugawo onwe-ha, ha nile abaghi n’ihe n’otù;

Ọ dighi onye nēme ihe ọma, ọ dighi ọbuná otù onye:

13 Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu;

Ha jiri ire-ha ghọ aghughọ:

Edide aju-ala di n’okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha:

14 Ndi ọnu-ha juru n’ọb͕ub͕a-iyi na ihe-ilu:

15 Ukwu-ha di ngwa iwusì ọbara;

16 Nbibi na ihuju-anya di n’uzọ nile ha;

17 Uzọ udo ka ha nāmaghi kwa:

18 Egwù Chineke adighi n’anya-ha.

19 Ma ayi matara na ka ha ra, bú ihe iwu Chineke nēkwu, ọ nāgwa ndi nọ n’okpuru iwu ahu; ka ewe kpuchita ọnu nile n’otù n’otù, ka ewe kwe na ikpé mara uwa nile n’ebe Chineke nọ:

20 n’ihi na site n’ọlu nile nke iwu ọ dighi madu ọ bula agāgu n’onye ezi omume n’iru Ya: n’ihi na ọ bu n’aka iwu ka nmazu nke nmehie sitere.

21 Ma ub͕u a emewo ka ezi omume Chineke puta ìhè nke nēguzo iche n’ebe iwu di, nke iwu ahu na ndi-amuma nāb͕ara ya àmà;

22 ma ọ bu ezi omume Chineke, site n’okwukwe ekwere na Jisus Kraist, nke diri ndi nile kwere: n’ihi na ọ dighi ihe di iche;

23 n’ihi na madu nile emehiewo, ha adighi-eru kwa otuto Chineke;

24 anēwere kwa amara-Ya nāgu ha na ndi ezi omume n’onyinye efu site na nb͕aputa ahu nke di nime Kraist Jisus:

25 Onye Chineke chere n’iru ọra madu ka Ọ buru ihe ijuru Ya obi, site n’okwukwe ekwere n’ọbara-Ya, igosi ezi omume-Ya, n’ihi nb͕aghara nmehie nile emehiereri n’oge gara aga, n’oge nnagide nke Chineke;

26 ka O we gosi ezi omume-Ya n’oge di ub͕u a, ka m’kwuru: ka Ya onwe-ya we buru onye ezi omume, buru kwa onye nāgu onye ahu n’onye ezi omume, bú onye nọ n’okwukwe ekwere na Jisus.

27 Òle ebe inya-isi-ayi di kwa? Emechibidowo ya n’èzi. Sìte n’aha iwu gini? ọ̀ bu nke ọlu? É-è: kama ọ bu site n’iwu nke okwukwe.

28 Ya mere ayi guru na anāgu madu n’onye ezi omume site n’okwukwe, mb͕e ọ kālughi ọlu iwu.

29 Ma-ọbu Chineke, Ọ̀ bu Chineke nke nání ndi-Ju? Ọ̀ bughi kwa Chineke nke ndi mba ọzọ? E, ọ bu kwa nke ndi mba ọzọ:

30 asi na ọ bu ezie na Chineke bu otù, Onye gāgu ndi obibì-úgwù na ndi ezi omume site n’okwukwe, were kwa okwukwe ahu gua ndi ebìghi-úgwù na ndi ezi omume.

31 Àyi nēsite kwa n’okwukwe-ayi me ka iwu ghara idi irè? Chineke ekwela: kama ayi nēme ka iwu guzo.

Categories
NDI ROM

NDI ROM 4

1 Gini kwa ka ayi gēkwu na Abraham huworo, bú nna-ayi ochie dika anu-aru si di?

2 N’ihi na asi na aguru Abraham n’onye ezi omume site n’ọlu, o nwere ihe inya isi; ma ọ bughi n’ebe Chineke nọ.

3 N’ihi na ọ̀ bu gini ka ihe edeworo n’akwukwọ nsọ nēkwu? Abraham we kwere Chineke, ewe gua nke ahu nye ya dika ezi omume.

4 Ma onye nālu ọlu, agughi ugwọ-ọlu-ya nye ya dika amara, kama dika ugwọ.

5 Ma onye nālughi ọlu, kama ọ kwere n’Onye ahu Nke nāgu onye nāsọpughi Chineke n’onye ezi omume, anāgu okwukwe-ya nye ya dika ezi omume.

6 Ọbuná dika Devid nāsi kwa na madu ahu bu onye ngọzi diri, bú onye Chineke nāgu ezi omume nye ya mb͕e ọ kālughi ọlu,

7 si,

Ngọzi nādiri ndi ab͕aghara nmebì-iwu nile ha,

Ndi ekpuchi-kwa-ra nmehie nile ha.

8 Ngọzi nādiri nwoke ahu onye Onye-nwe-ayi nāgaghi-agu nmehie nye ya.

9 Ọ̀ bu kwa ndi obibì-úgwù ka anākpọ ndi ngọzi a diri, ma-ọbu kwa ndi ebìghi-úgwù? n’ihi na ayi nāsi, Aguru okwukwe Abraham nye ya dika ezi omume.

10 Èsi kwa aṅa gu ya? àguru ya nye ya mb͕e ọ nọ n’obibì-úgwù, ma-ọbu mb͕e ọ nọ n’ebìghi-úgwù? Ọ bughi n’obibì-úgwù, kama ọ bu n’ebìghi-úgwù:

11 ọ we nara ihe-iriba-ama nke bu obibì-úgwù, bú akàrà nke ezi omume nke okwukwe ahu nke di n’ebìghi-úgwù-ya: ka o we buru nna nke ndi nile kwere, ọ bu ezie na ha nọ n’ebìghi-úgwù, ka ewe gua ezi omume nye ha;

12 ka o we buru kwa nna nke obibì-úgwù n’ebe ndi ahu nọ, bú ndi nābughi nání ndi sitere n’obibì-úgwù, kama ha nēsozi kwa ije-ukwu nke okwukwe ahu nke nna-ayi Abraham, nke o nwere n’ebìghi-úgwù.

13 N’ihi na esiteghi n’iwu kwere Abraham ma-ọbu nkpuru-ya nkwa, na ọ gābu onye-nketa nke uwa, kama o sitere n’ezi omume nke okwukwe.

14 N’ihi na asi na ndi ahu ndi sitere n’iwu bu ndi-nketa, emewo okwukwe ka ọ buru ihe-efu, me kwa nkwa ahu ka ọ ghara idi irè:

15 n’ihi na iwu ahu nāluta iwe; ma ebe iwu nādighi, njehie adighi kwa.

16 N’ihi nka o sitere n’okwukwe, ka o we di ka amara si di; ka nkwa ahu we guzosie ike n’ebe nkpuru ahu nile nọ; ọ bughi nání ndi sitere n’iwu ahu, kama ọ bu kwa ndi sitere n’okwukwe Abraham, onye bu nna nke ayi nile.

17 (dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si, Nna nke ọtutu mba ka M’meworo gi,) n’iru Onye o kwere, bú Chineke, Onye nēme ndi nwuru anwu ka ha di ndu, Onye nākpọ kwa ihe nādighi, dika asi na ha di.

18 Onye kwere mb͕e ọ gasiri oge olile-anya, ebe ọ dabere n’olile-anya, ka o we ghọ nna ọtutu mba, dika ihe ekwururi si di, Otú a ka nkpuru-gi gādi.

19 O we tugharia uche n’aru nke onwe-ya nke nwuwori, (ebe ọ b͕ara ihe di ka ọgu arọ ise), tughari kwa uche n’àkpà-nwa Sera na ọ bu ihe nwuru anwu, ma emeghi ya ka ọ ghara idi ike n’okwukwe-ya:

20 o jighi kwa ekweghi-ekwe nwe obi abua n’ebe nkwa Chineke di, kama ejiri okwukwe-ya me ka o nwe ike, ọ nēnye kwa Chineke otuto,

21 nēkwezu kwa na ihe O kwereri na nkwa, Ọ puru ime kwa.

22 N’ihi ya agu-kwa-ra ya nye ya dika ezi omume.

23 Ma ọ bughi n’ihi nání ya ka edeworo ya n’akwukwọ nsọ, na aguru ya nye ya;

24 kama ọ bu kwa n’ihi ayi, ndi agaje igu ya nye ayi, ndi kwere n’Onye ahu Nke mere ka Jisus Onye-nwe-ayi si na ndi nwuru anwu bilie,

25 Onye arara Ya nye n’ihi ndahie-ayi nile, ewe me ka O si n’ọnwu bilie n’ihi igu ayi na ndi ezi omume.