Categories
JỌN

JỌN 14

1 Ka obi-unu ghara ilọ miri: kwerenu na Chineke, kwere-kwa-nu na Mu.

2 N’ulo Nnam ọtutu ebe-obibi di; ọ buru na ọ bughi otú a, M’gāgwawori unu; n’ihi na anamaga idoziri unu ebe.

3 Ọ buru kwa na Mu aga idoziri unu ebe, agajem ibia ọzọ, M’gānara kwa unu nye Onwem; ka unu onwe-unu we nọ kwa ebe Mu onwem nọ.

4 Ebe Mu onwem nāla, unu mata-kwa-ra uzọ-ya.

5 Tomas si Ya, Onye-nwe-ayi, ayi amataghi ebe I nāla; àyi si aṅa mata uzọ-ya?

6 Jisus si ya, Mu onwem bu uzọ, na ezi-okwu, na ndu: ọ dighi onye ọ bula nābiakute Nnam, ma-ọbughi site na Mu.

7 Ọ buru na unu maramri, unu gāmatawo-kwa-ri Nnam: site n’ub͕u a unu mara Ya, unu ahuwo kwa Ya.

8 Filip si Ya, Onye-nwe-ayi, gosi ayi Nna ahu, ọ gēzu-kwa-ra ayi.

9 Jisus si ya, Ogologo oge di otú a ka Mu na gi nọ, ma ì mataghm, Filip? onye huworom anya ahuwo Nnam anya; gì onwe-gi si aṅa si, Gosi ayi Nnam ahu?

10 Ì kweghi na Mu onwem nọ nime Nnam, Nnam nọ kwa nimem? okwu Mu onwem nāgwa unu ekwughi m n’Onwem: ma Nnam Nke nēbi nimem nālu ọlu-Ya.

11 Kwerenum na Mu onwem nọ nime Nnam, Nnam nọ kwa nimem: ma ọ bughi, kwerenum n’ihi ọlum onwe-ha.

12 N’ezie, n’ezie, asim unu, Onye nēkwere na Mu, ọlu Mu onwem nālu ka onye ahu gālu kwa; ọlu ka ndia uku ka ọ gālu kwa; n’ihi na Mu onwem nāgakuru Nnam.

13 Ihe ọ bula unu gāriọ kwa n’aham, ihe ahu ka M’gēme, ka ewe nye Nnam otuto nime Ọkpara-Ya.

14 Ọ buru na unu gāriọm ihe ọ bula n’aham, nke ahu ka M’gēme.

15 Ọ buru na unu nāhum n’anya, unu gēdebe ihe nile M’nyere n’iwu.

16 Mu onwem gēkpe-kwa-ra Nnam, Ọ gēnye kwa unu Onye-nkasi-obi ọzọ, ka Ọ nọyere unu rue mb͕e ebighi-ebi,

17 bú Mọ nke ezi-okwu: Onye uwa nāpughi inara; n’ihi na ọ dighi-ahu ya, ọ dighi-ama kwa Ya: unu onwe-unu mara Ya; n’ihi na Ya na unu nānọgide, Ọ gānọ kwa nime unu.

18 M’gaghi-arapu unu ka umu-nb͕ei: agajem ibiakute unu.

19 Ọ fọduru nwa oge, uwa ahukwaghm ọzọ; ma unu onwe-unu nāhum: unu onwe-unu gādi kwa ndu, n’ihi na Mu onwem nādi ndu.

20 N’ubọchi ahu unu onwe-unu gāmara na Mu onwem nọ nime Nnam, na unu onwe-unu nọ kwa nimem, na Mu onwem nọ kwa nime unu.

21 Onye nwere ihe M’nyere n’iwu, nke nēdebe kwa ha, ọ bu onye ahu nāhum n’anya: onye nāhum n’anya, Nnam gāhu kwa ya n’anya, Mu onwem gāhu kwa ya n’anya, were kwa Onwem gosi ya.

22 Judas (ọ bughi Iskariot) si Ya, Onye-nwe-ayi, Gini putaworo na I gaje iwere Onwe-gi gosi ayi, ma ọ bughi uwa?

23 Jisus zara, si ya, Ọ buru na madu ahum n’anya, ọ gēdebe okwum: Nnam gāhu kwa ya n’anya, Ayi gābiakute kwa ya, nēme kwa ebe-obibi-Ayi n’ebe ọ nọ.

24 Onye nādighi-ahum n’anya adighi-edebe okwum nile: okwu nke unu nānu abughi kwa nkem, kama ọ bu nke Nna Onye ziterem.

25 Okwu ndia ka M’gwaworo unu, mb͕e Mu na unu nānọgide.

26 Ma Onye-nkasi-obi ahu, bú Mọ Nsọ, Onye Nnam gēzite n’aham, Onye ahu gēzí unu ihe nile, me kwa ka unu cheta okwu nile Mu onwem gwara unu.

27 Udo ka M’rapuru unu; udo nkem ka M’nēnye unu: ọ bughi dika uwa nēnye ka Mu onwem nēnye unu. Ka obi-unu ghara ilọ miri, ka ọ ghara kwa itu ujọ.

28 Unu nuru na Mu onwem siri unu, Anamala, biakute kwa unu. Ọ buru na unu hurum n’anya, unu gāṅuwori ọṅu, n’ihi na anamagakuru Nnam: n’ihi na Nnam ka Mu onwem uku.

29 Ub͕u a agwawokwam unu mb͕e ọ kērughi, ka unu we kwere mb͕e ọ bula ọ gēru.

30 Ọ dighi ọtutu okwu Mu na unu gēkwu ọzọ site n’ub͕u a, n’ihi na onye-isi nke uwa nka nābia: ọ dighi kwa ihe ọ bula o nwere nimem;

31 ma ka uwa we mara na anamahu Nnam n’anya, ka ọ mara kwa na dika Nnam nyerem iwu, otú ahu ka M’nēme. Bilienu, ka ayi si n’ebe a pua.

Categories
JỌN

JỌN 15

1 Mu onwem bu ezi osisi vine, Nnam bu kwa onye-ọlu-ubi.

2 Alaka ọ bula nimem nke nādighi-ami nkpuru, O wepu ya: alaka ọ bula nke nāmi nkpuru, O nēme kwa ya ka ọ di ọcha, ka o we mia nkpuru kari.

3 Ub͕u a unu onwe-unu di ọcha n’ihi okwu nke M’gwaworo unu.

4 Nọgidenu nimem, Mu onwem kwa nime unu. Dika alaka nāpughi imi nkpuru n’onwe-ya, ọ buru na ọ nọgideghi n’osisi vine; otú a ka unu onwe-unu nāpughi, ọ buru na unu anọgideghi nimem.

5 Mu onwem bu osisi vine ahu, unu onwe-unu bu alaka nkem: Onye nānọgide nimem, Mu onwem kwa nime ya, onye ahu nāmi nkpuru ri nne: n’ihi na unu apughi ime ihe ọ bula ma Mu anọghi ya.

6 Ọ buru na onye ọ bula anọgideghi nimem, atupu ya n’èzí dika alaka, ọ kpọnwu kwa; ha we chikọta ha, tubà ha n’ọku, ewe rechapu ha ọku.

7 Ọ buru na unu nānọgide nimem, ọ buru kwa na okwum nānọgide nime unu, riọnu ihe o bula unu nāchọ, agēme-kwa-ra unu ya.

8 Nime nka ka anēnye Nnam otuto, ka unu nāmi nkpuru ri nne; unu gābu kwa ndi nēso uzọm.

9 Dika Nnam hurum n’anya, Mu onwem hu-kwa-ra unu n’anya: nọgidenu nime ihu-n’anyam.

10 Ọ buru na unu edebe ihe nile M’nyere n’iwu, unu gānọgide n’ihu-n’anyam; dika Mu onwem debeworo ihe nile Nnam nyere n’iwu, nọgide kwa n’ihu-n’anya-Ya.

11 Ihe ndia ka M’gwaworo unu, ka ọṅùm we di nime unu, ka ọṅù-unu we zu kwa.

12 Nka bu ihe M’nyere n’iwu ka unu hurita ibe-unu n’anya, dika M’huru unu n’anya.

13 Ọ dighi onye ọ bula nwere ihu-n’anya kari nka uku, ka madu tọb͕ọ ndu-ya n’ihi ndi-enyì-ya.

14 Unu onwe-unu bu ndi-eyìm, ma ọ buru na unu eme ihe Mu onwem nēnye unu n’iwu.

15 Akpọkwaghm unu ndi-orù ọzọ site n’ub͕u a; n’ihi na orù adighi-amara ihe onye-nwe-ya nēme: ma akpọwom unu ndi-eyì; n’ihi na ihe nile M’nuru site n’ọnu Nnam ka M’mere ka unu mara.

16 Ọ bughi unu onwe-unu rọputaram, kama ọ bu Mu onwem rọputara unu, weputa kwa unu iche, ka unu onwe-unu we je mia nkpuru, ka nkpuru-unu we nọgide kwa: ka ihe ọ bula unu gāriọ Nnam n’aham, ka O we nye unu ya.

17 Ihe ndia ka M’nēnye unu n’iwu, ka unu we hurita ibe-unu n’anya.

18 Ọ buru na uwa akpọ unu asì, unu mara na ọ kpọwo Mu onwem asì mb͕e ọ kākpọghi unu asì.

19 Ọ buru na unu sitere n’uwa, uwa gāhu ihe nke aka ya n’anya: ma n’ihi na unu esiteghi n’uwa, kama Mu onwem rọputara unu nime uwa, n’ihi nka uwa nākpọ unu asì.

20 Chetanu okwu Mu onwem gwara unu, Orù adighi-aka onye-nwe-ya uku. Ọ buru na ha sob͕urum, ha gēsọb͕u kwa unu; ọ buru na ha debere okwum, ha gēdebe kwa nke unu.

21 Ma ihe ndia nile ka ha gēme unu n’ihi aham, n’ihi na ha amataghi Onye ziterem.

22 Ọ buru na abiaghm, ọ buru kwa na agwaghm ha okwu, ha agaghi-enwewori nmehie: ma ub͕u a ha enweghi ihe-agugọ bayere nmehie-ha.

23 Onye nākpọm asì nākpọ kwa Nnam asì.

24 Ọ buru na alughm ọlu n’etiti ha nke onye ọzọ nālughi, ha agaghi-enwewori nmhie: ma ub͕u a ha ahuwo kpọ kwa Mu na Nnam asì.

25 Ma nka mere, ka okwu edeworo n’iwu-ha we mezu, Ha kpọrọm asì n’efu.

26 Ma mb͕e ọ bula Onye-nkasi-obi ahu gābia, Onye Mu onwem gēsi n’ebe Nnam nọ zitere unu, bú Mọ nke ezi-okwu, Onye si na Nnam puta, Onye ahu gāb͕aram àmà:

27 unu onwe-unu nāb͕a kwa àmà, n’ihi na Mu na unu nọ site na mbu.

Categories
JỌN

JỌN 16

1 Okwu ndia ka M’gwaworo unu, ka ewe ghara ime ka unu ma n’ọnyà.

2 Ha gāchupu unu nime ulo-nzukọ: e, oge hour nābia, ka ọ gābu na onye ọ bula nke gēb͕u unu gēchè na ọ nējere Chineke ozi.

3 Ihe ndia ka ha gēme kwa, n’ihi na ha amaghi Nnam, ha amaghi kwa Mu.

4 Ma okwu ndia ka M’gwaworo unu, ka, mb͕e ọ bula oge hour ha gābia, ka unu we cheta ha, na Mu onwem gwara unu. Ma agwaghm unu okwu ndia site na mbu, n’ihi na Mu na unu nọri.

5 Ma ub͕u a anamalakuru Onye ziterem; ọ dighi kwa onye ọ bula nime unu nājum, Òle ebe I nāla?

6 Kama n’ihi na M’gwawo unu okwu ndia, ihe-nwuta ejuputawo obi-unu.

7 Otú ọ di, Mu onwem nāgwa unu ezi-okwu; Ọ bu ihe bara unu urù ka Mu onwem la: n’ihi na asi na alaghm, Onye-nkasi-obi ahu agaghi-abiakute unu; ma ọ buru na alam, M’gēzite Ya nye unu.

8 Onye ahu, mgbe Ọ gābia, Ọ gātu kwa uwa nmehie, na ezi omume, na ikpé, n’anya:

9 nmehie, n’ihi na ha ekweghi na Mu;

10 ezi omume, n’ihi na anamalakuru Nnam, unu adighi-ahu-kwam ọzọ site n’ub͕u a;

11 ikpé, n’ihi na ekpewo onye-isi uwa nka ikpé.

12 Enwerem ọtutu ihe ọzọ igwa unu, ma unu apughi ibūru ha ub͕u a.

13 Ma mb͕e ọ bula Onye ahu gābia, bú Mọ nke ezi-okwu, Ọ gēdubà unu n’ezi-okwu nile: n’ihi na Ọ gaghi-ekwu n’Onwe-ya; kama ka ihe Ọ nānu ra, ihe ndia ka Ọ gēkwu: Ọ gākọ-kwa-ra unu ihe nile nke nābia.

14 Onye ahu gēto Mu onwem: n’ihi na Ọ gēwere n’ihe nkem, kọ-kwa-ra unu ya.

15 Ka ha ra, bú ihe nile Nnam nēnwe, bu nkem: n’ihi nka ka M’siri, na Ọ nēwere n’ihe nkem, gākọ-kwa-ra unu ya.

16 Ọ fọduru nwa oge, unu adighi-ahukwam, ọzọ kwa, ọ fọduru nwa oge, unu gāhukwam.

17 Ya mere ufọdu nime ndi nēso uzọ-Ya siritara ibe-ha, Gini bu okwu a nke Ọ nāgwa ayi, si, Ọ fọduru nwa oge, unu adighi-ahukwam, ọzọ kwa, ọ fọduru nwa oge, unu gāhukwam: na, N’ihi na anamalakuru Nnam?

18 Ya mere ha nāsi, Gini bu okwu a nke Ọ nēkwu, Ọ fọduru nwa oge? Ayi amataghi ihe Ọ nēkwu.

19 Jisus mara na ha nāchọ iju Ya, O we si ha, Ùnu nājurita onwe-unu ihe bayere nka, na M’siri, Ọ fọduru nwa oge, unu adighi-ahukwam ọzọ; ọzọ kwa, ọ fọduru nwa oge, unu gāhukwam?

20 N’ezie, n’ezie, asim unu, na unu onwe-unu gēti nkpu ákwá, kwa kwa ákwá, ma uwa gāṅuri ọṅu: ọ gēwuta unu onwe-unu, ma nwuta-unu gāghọ ọṅù.

21 Nwanyi, mb͕e ọ bula ime nēme ya, o nwere ihe-nwuta, n’ihi na oge hour ya abiawo: ma mb͕e ọ bula ọ muputara nwa, o chetaghi ahuhu-ya ọzọ, n’ihi ọṅù-ya na amuputara madu n’uwa.

22 Ya mere unu onwe-unu nēnwe kwa ihe-nwuta ub͕u a: ma M’gāhu unu ọzọ, obi-unu gāṅuri kwa ọṅu, ọ dighi kwa onye ọ bula gānara unu ọṅù-unu.

23 N’ubọchi ahu ọ dighi ihe ọ bula unu gājum. N’ezie, n’ezie, asim unu, Ọ buru na unu gāriọ Nnam ihe ọ bula, Ọ gēnye unu ya n’aham.

24 Rue ub͕u a unu akāriọghi ihe ọ bula n’aham: riọnu, unu gāriọta kwa, ka ọṅù-unu we zue oke.

25 Agwawom unu ihe ndia n’ilu: oge hour nābia, mb͕e M’nāgaghi-agwa unu okwu n’ilu ọzọ, kama M’gāgwawa unu okwu bayere Nnam.

26 N’ubọchi ahu unu gāriọ n’aham: ma asighm unu, na Mu onwem gēkpere Nnam n’ihi unu;

27 n’ihi na Nnam onwe-ya nāhu unu n’anya, n’ihi na unu onwe-unu huworom n’anya, kwere kwa na Mu onwem siri n’ebe Nnam nọ puta.

28 Esirim na Nnam puta, abiawokwam n’uwa: ọzọ, anamarapu uwa, nāgakuru kwa Nnam.

29 Ndi nēso uzọ-Ya si, Le, ub͕u a I nēkwuwa okwu, I dighi-atu kwa ilu.

30 Ub͕u a ayi nāmata na I matara ihe nile, na ọ dighi kwa Gi nkpà ka onye ọ bula jua Gi: nka ka ayi ji kwere na I siri n’ebe Chineke nọ puta.

31 Jisus zara ha, si, Ọ̀ bu ub͕u a ka unu kwere?

32 Le, oge hour nābia, ọ biawo kwa, ka unu gāb͕asa, onye ọ bula ọ la na nke ya, unu gārapu kwa nání Mu: otú ọ di, nání Mu anọghi, n’ihi na Mu na Nnam nọ.

33 Okwu ndia ka M’gwaworo unu, ka unu we nwe udo nimem. N’uwa unu nēnwe nkpab͕u: ma nwenu obi-ike; Mu onwem emeriwo uwa.

Categories
JỌN

JỌN 17

1 Okwu ndia ka Jisus kwuru: O we welie anya-Ya le elu-igwe, si, Nnam oge hour abiawo; nye Ọkpara-Gi otuto, ka Ọkpara-Gi we nye Gi Otuto:

2 dika I nyere Ya ike n’ebe madu nile nọ, ka ihe ọ bula I nyeworo Ya, ka O we nye ha ndu ebighi-ebi.

3 Ma nka bu ndu ebighi-ebi ahu, ka ha mara Gi, Nke nání Gi bu ezi Chineke, mara kwa Onye I zitere, bú Jisus Kraist.

4 Mu onwem nyere Gi otuto n’elu uwa, ebe M’luzuru ọlu I nyeworom ka M’lua.

5 Nna, Gi onwe-gi were kwa otuto nke M’nwere n’ebe I nọ mb͕e uwa akādighi nyem otuto ub͕u a nebe Gi onwe-Gi nọ.

6 Emerem ka aha-Gi puta ìhè nye ndi I nyerem site ‘uwa: Gi onwe-gi nwere ha, I were kwa ha nyem; ha edebewo kwa okwu-Gi.

7 Ha mara ub͕u a na ihe nile, ka ha ra, bú nke I nyeworom, si n’ebe I nọ puta:

8 n’ihi na okwu I nyerem ka M’nyeworo ha; ha onwe-ha we nara ha, mara kwa n’ezie na esim n’ebe I nọ puta, ha kwere kwa na Gi onwe-gi ziterem.

9 Mu onwem nēkpe ekpere bayere ha: ọ bughi uwa ka M’nēkpe ekpere bayere ya, kama anamekpe ekpere bayere ndi I nyeworom; n’ihi na ha bu nke Gi:

10 ihe nile nke bu nkem bu kwa nke Gi, nke Gi bu kwa nkem: enyewokwam otuto nime ha.

11 Anọkwaghm n’uwa ọzọ, ma ndia nọ n’uwa, Mu onwem nābiakute kwa Gi. Nna di nsọ, nēdebe ha n’aha-Gi nke I nyeworom, ka ha we buru otù, dika Ayi onwe-ayi bu.

12 Mb͕e Mu na ha nọri, Mu onwem nēdebe ha n’aha-Gi nke I nyeworom: eche-kwa-ram ha, ọ dighi kwa onye ọ bula nime ha lara n’iyì, ma-ọbughi nwa nke ila-n’iyì ahu; ka ihe edeworo n’akwukwọ nsọ we mezu.

13 Ma anamabiakute Gi ub͕u a; okwu ndia ka M’nēkwu kwa nuwa, ka ha we nwe ọṅùm ka o zuworo nime onwe-ha.

14 Mu onwem enyewo ha okwu-Gi; uwa kpọ-kwa-ra ha asì, n’ihi na ha esiteghi n’uwa, dika Mu onwem nēsiteghi n’uwa.

15 Ekpeghm ekpere ka I wepu ha n’uwa, kama ka I debe ha ka ha pua n’aka ajọ onye ahu.

16 Ha esiteghi n’uwa, dika Mu onwem nēsiteghi n’uwa.

17 Were ezi-okwu do ha nsọ: okwu-Gi bu ezi-okwu.

18 Dika I zigaram nime uwa, Mu onwem ziga-kwa-ra ha nime uwa.

19 N’ihi ha ka Mu onwem nēdo kwa Onwem nsọ, ka ewe do kwa ha onwe-ha nsọ n’ezi-okwu.

20 Ọ bughi kwa nání ndia ka M’nēkpe ekpere bayere ha, kama anamekpe kwa ekpere bayere ndi kwere na Mu site n’okwu-ha;

21 ka ha nile we buru otù; dika Gi onwe-gi di nimem, dika Mu onwem di kwa nime Gi, Nna, ka ha onwe-ha we di kwa nime Ayi: ka uwa we kwere na Gi onwe-gi ziterem.

22 Otuto nke I nyeworom ka Mu onwem nyewo-kwa-ra ha; ka ha we buru otù, dika Ayi onwe-ayi bu otù;

23 Mu onwem nime ha, Gi onwe-gi kwa nimem, ka ewe me ka ha buru ndi zuworo okè ibu otù; ka uwa we mara na Gi onwe-gi ziterem, na I hu-kwa-ra ha n’anya, dika I hurum n’anya.

24 Nna, ihe I nyeworom, anamachọ ka, ebe Mu onwem nọ, ka Mu na ndi ahu nọ kwa; ka ha we hu otutom, nke I nyeworom: n’ihi na I hurum n’anya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa.

25 Nna Nke bu Onye ezi omume, uwa amaghi Gi, ma Mu onwem mara Gi; ndia ndia ma-kwara na Gi onwe-gi ziterem;

26 eme-kwa-ram ka ha mara aha-Gi, M’gēme kwa ka ha mara ya; ka ihu-n’anya I ji hum we di nime ha, Mu onwem kwa nime ha.

Categories
JỌN

JỌN 18

1 Mb͕e Jisus kwusiri okwu ndia, Ọ pua, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, gabiga n’ofè iyi Kidron, ebe ubi ab͕ara ogige di, nke Ọ bàra nime ya, Ya onwe-ya na ndi nēso uzọ-Ya.

2 Ma Judas, onye nārara Ya nye, mata-kwa-ra ebe ahu: n’ihi na Jisus na ndi nēso uzọ-Ya zukọrọ n’ebe ahu ọtutu oge.

3 Ya mere Judas, ebe ọ natara òtù ndi-agha, na ndi nēje ozi site n’aka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi, ọ chiri oriọna na ọwa na ihe-agha bia n’ebe ahu.

4 Ya mere Jisus, ebe Ọ matara ihe nile nābiakwasi Ya, Ọ pua, si ha, Ònye ka unu nāchọ?

5 Ha zara Ya, si, Jisus Onye Nazaret. Jisus siri ha, Mu onwem bu Ya. Ma Judas, onye nārara Ya nye, nēguzo kwa n’etiti ha.

6 Ya mere mb͕e Ọ siri ha, Mu onwem bu Ya, ha la azu, we da n’ala.

7 Ya mere Ọ juru ha ọzọ, si, Ònye ka unu nāchọ? Ha si, Jisus Onye Nazaret.

8 Jisus zara, si, Agwaram unu na Mu onwem bu Ya: ya mere ọ buru na unu nāchọm, ka ndia la:

9 ka okwu O kwuru we mezu, si, N’etiti ndi I nyeworom ọ dighi onye ọ bula M’tufuru.

10 Ya mere Saimon Pita, ebe o ji mma-agha, ọ miputa ya, b͕ue orù onye-isi-nchu-àjà mma, bipu nti aka-nri ya. Ma aha orù ahu bu Malkọs.

11 Ya mere Jisus siri Pita, Miye mma-agha-gi n’ọbọ-ya: iko nke Nnam nyeworom, M’gaghi-aṅu ya?

12 Ya mere òtù ndi-agha ahu na ọchi-agha, na ndi nējere ndi-Ju ozi, jidere Jisus ke kwa Ya ab͕u,

13 we buru uzọ duru Ya jekuru Anas; n’ihi na ya bu nna nwunye Kaiafas, onye bu onye-isi-nchu-àjà arọ ahu.

14 Ma Kaiafas bu onye ahu nke dururi ndi-Ju ọdú, na ọ bara urù ka otù onye nwua n’ọnọdu ndi-Ju.

15 Saimon Pita we so Jisus, ya na onye ọzọ nke nēso uzọ Jisus. Ma onye ahu nke nēso uzọ Jisus bu onye onye-isi-nchu-aja mara, o we so Jisus ba n’obí onye-isi-nchu-àjà;

16 ma Pita nēguzo n’èzí n’ọnu-uzọ. Ya mere onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus, onye onye-isi-nchu-àjà mara, we pua gwa nwanyi nke nēche ọnu-uzọ okwu, we dubata Pita.

17 Ya mere nwa-ab͕ọghọ ahu nke nēche ọnu-uzọ si Pita, Ọ̀ gābu na gi onwe-gi bu kwa otù onye n’etiti ndi nēso uzọ Nwoke a? Pita si, Abughi m.

18 Ma ndi-orù na ndi nēje ozi guzoro n’ebe ahu, ebe ha funwusiri ọku icheku; n’ihi na oyi nātu; ha nānya kwa ọku: Pita nọ kwa n’etiti ha, nēguzo nānya kwa ọku.

19 Ya mere onye-isi-nchu-àjà juru Jisus ajuju bayere ndi nēso uzọ-Ya, na ajuju bayere ozizí-Ya.

20 Jisus zara ya, si, Mu onwem agwawawo uwa okwu; Mu onwem zíri ihe mb͕e nile n’ulo-nzukọ, na n’ulo uku Chineke, ebe ndi-Ju nile nāb͕akọ; ekwukwaghi m ihe ọ bula na nzuzo.

21 Gini mere i nāju Mu onwem? jua ndi nuworo okwum, ihe M’gwara ha: le, ndia matara ihe nile Mu onwem kwuru.

22 Ma mb͕e O kwusiri okwu ndia, otù onye nime ndi nēje ozi nke nēguzo nso we pia Jisus ihe, si, Ì nāza onye-isi-nchu-àjà otú a?

23 Jisus zara ya, si, Ọ buru na M’kwuru nke-ọjọ, b͕ara ihe ọjọ ahu àmà: ma ọ buru nke-ọma, gini mere i nētim aka?

24 Ya mere Anas zigara Ya n’ab͕u jekuru Kaiafas onye-isi-nchu-àjà.

25 Ma Saimon Pita nēguzo nānya kwa ọku. Ya mere ha siri ya, Ọ̀ gābu na gi onwe-gi bu kwa otù onye nime ndi nēso uzọ-Ya? Onye ahu gọrọ, si, Abughi m.

26 Otù onye nime ndi-orù onye-isi-nchu-àjà, buri onye-ikwu nke onye ahu Pita bipuru nti-ya, si, Mù onwem ahughi gi na Ya n’ubi ahu ab͕ara ogige?

27 Ya mere Pita gọ-kwa-ra ọzọ: ngwa ngwa oke-ọkuku we kwa.

28 Ya mere ha si na nke Kaiafas duru Jisus ba na Pritoriọm: ọ bu kwa n’isi-ututu; ma ha onwe-ha abàghi nime Pritoriọm ahu, ka aghara imeru ha, kama ka ha we rie oriri ngabiga.

29 Ya mere Pailat pukuru ha n’èzí, si, Ọ̀ bu ebubo gini ka unu nēbo Nwoke a?

30 Ha zara, si ya, Ọ buru na Onye a abughi onye nēme ihe ọjọ, ayi agaghi-ararawori Ya nye n’aka-gi.

31 Ya mere Pailat siri ha, Unu onwe-unu were Ya, kpe-kwa-nu Ya ikpé dika iwu-unu si di. Ndi-Ju siri ya, O zighi ayi ezi n’iwu ib͕u onye ọ bula:

32 ka okwu Jisus we mezu, nke O kwuru, nēgosi aha ọnwu Ọ gajē inwu.

33 Ya mere Pailat bà-kwa-ra ọzọ nime Pritoriọm, we kpọ Jisus, si Ya, Gì onwe-gi bu Eze ndi-Ju?

34 Jisus zara, si, Gì onwe-gi nēkwu nka n’onwe-gi, ma-ọbu na ndi ọzọ gwara gi okwu bayerem?

35 Pailat zara, si, Mù onwem bu onye-Ju? Mba nke Gi na ndi-isi-nchu-àjà rara Gi nye n’akam: gini ka I mere?

36 Jisus zara, si, Ala-ezem esiteghi n’uwa nka: ọ buru na ala-ezem sitere n’uwa nka, ndi nējerem ozi gālu ọ̀gù, ka aghara iraram nye n’aka ndi-Ju: ma ub͕u a ala-ezem esighi n’ebe a puta.

37 Ya mere Pailat siri Ya, Gì onwe-gi bu kwa eze? Jisus zara, si, Gi onwe-gi nāsi na Mu onwem bu eze. Amuwo Mu onwem ime ihe a, abiawokwam nime uwa ime ihe a, ka M’we b͕ara ezi-okwu àmà. Onye ọ bula nke sitere n’ezi-okwu ahu nānu olum.

38 Pailat si Ya, Gini bu ezi-okwu?

Mb͕e o kwusiri nka, o we pukuru ndi-Ju ọzọ, si ha, Mu onwem ahughi ihe kwesiri ahuhu-nmehie nime Ya.

39 Ma unu nwere ome-n’ala, ka m’rapuru unu otù onye n’ememe ngabiga: ùnu nēzube kwa ka M’rapuru unu Eze ndi-Ju?

40 Ya mere ha tiri nkpu ọzọ, si, Ọ bughi Onye a, kama ọ bu Barabas. Ma Barabas bu onye nāpunara madu ihe.

Categories
JỌN

JỌN 19

1 Ya mere mb͕e ahu Pailat were Jisus, pia Ya ihe.

2 Ndi-agha we kpa okpu-eze nke eji ogwu me, ha were ya kpube Ya n’isi, were kwa uwe odobo b͕okwasi Ya;

3 ha we nābiakute Ya, nāsi, Ekele, Eze ndi-Ju! ha nāpia kwa Ya ihe.

4 Pailat we pu kwa ọzọ n’èzí, si ha, Le, anamekuputa Ya n’èzí nye unu, ka unu we mara na ahughim ihe kwesiri ahuhu-nmehie nime Ya.

5 Ya mere Jisus putara n’èzí, nēkpu okpu-eze ahu nke eji ogwu me, nēyi kwa uwe odobo ahu. Pailat we si ha, Le, Nwoke ahu!

6 Ya mere mb͕e ndi-isi-nchu-àjà na ndi nēje ozi huru Ya, ha tie nkpu, si, Kpọgide Ya n’obe, kpọgide Ya n’obe. Pailat si ha, Unu onwe-unu were Ya, kpọgide kwa Ya n’obe: n’ihi na mu onwem ahughi ihe kwesiri ahuhu-nmhie nime Ya.

7 Ndi-Ju zara ya, si, Ayi onwe-ayi nwere iwu, ma dika iwu ahu si di O kwesiri inwu ọnwu, n’ihi na O mere Onwe-ya Ọkpara Chineke.

8 Ya mere mb͕e Pailat nuru okwu a, ọ tukariri egwu;

9 o we ba nime Pritoriọm ọzọ, we si Jisus, Òle ebe Gi onwe-gi si bia? ma ọ dighi ọziza Jisus zara ya.

10 Ya mere Pailat si Ya, Ì dighi-agwam okwu? Ì mataghi na m’nwere ike irapu Gi, m’nwe-kwa-ra ike ikpọgide Gi n’obe?

11 Jisus zara ya, si, I gaghi-enwe ike ọ bula imegidem, ọ buru na esighi n’elu nye gi ya-ri: n’ihi nka onye raram nye n’aka-gi nwere nmehie kari.

12 Site na nka Pailat nāchọ uzọ irapu Ya: ma ndi-Ju tiri nkpu, si, Ọ buru na i rapu Onye a, i bughi eyì Sisa: onye ọ bula nke nēme onwe-ya eze nēkwu okwu imegide Sisa.

13 Ya mere mb͕e Pailat nuru okwu ndia, o duputa Jisus n’èzí, we nọkwasi oche-ikpé n’ebe anākpọ Pavement, ma n’asusu Hibru, Gabata.

14 Ma ọ bu ubọchi Nkwadebe nke ememe ngabiga: ọ di ka oge hour nke-isi. O we si ndi-Ju, Le, Eze-unu!

15 Ya mere ndi ahu tiri nkpu, si, Wepu Ya, wepu Ya, kpọgide Ya n’obe. Pailat si ha, M’gākpọgide Eze-unu n’obe? Ndi-isi-nchu-àjà zara, si, Ayi enweghi eze ma-ọbughi Sisa.

16 Ya mere mb͕e ahu ọ rara Ya nye n’aka-ha, ka ewe kpọgide Ya n’obe.

17 Ya mere ha kuru Jisus tiyere onwe-ha: O we pua, nēbu obe-Ya n’Onwe-ya, ga rue ebe anākpọ Ebe okpokoro-isi, nke anākpọ n’asusu Hibru Gọlgọta:

18 ebe ha kpọgidere Ya n’obe, Ya na ndikom abua ọzọ, otù n’akuku a otù n’akuku ọzọ, Jisus nọ kwa n’etiti ha.

19 Pailat we de kwa ihe-ndekwasi, debe ya n’elu obe-Ya. Ma ihe edeworo bu, Jisus ONYE NAZARET EZE NDI-JU.

20 Ya mere ọtutu n’etiti ndi-Ju guru ihe-ndekwasi ahu: n’ihi na ebe akpọgidere Jisus n’obe di obodo Jerusalem nso: ede-kwa-ra ya n’asusu Hibru, n’asusu Latin, n’asusu Grik.

21 Ya mere ndi-isi-nchu-àjà nke ndi-Ju si Pailat, Edela, Eze ndi-Ju; kama, na Onye ahu siri, Abum Eze ndi-Ju.

22 Pailat zara, si, Ihe m’deworo, edewom ya.

23 Ya mere ndi-agha, mb͕e ha kpọgidesiri Jisus n’obe, ha chiri uwe-Ya, kè ha òkè anọ, otù onye otù òkè otù onye otù òkè; ha chi-kwa-ra uwe-ime-Ya: ma uwe-ime ahu enweghi ọb͕ub͕a, akpara ya site n’elu we gazu n’aru uwe-ime ahu dum.

24 Ya mere ha siritara onwe-ha, Ka ayi ghara idọwa ya, kama ka ayi fere ya nzà, onye ọ gābu nke ya: ka ihe edeworo n’akwukwọ nsọ we mezue, nke si,

Ha kère uwem nye onwe-ha,

N’elu ihe m’nēyi n’aru ka ha fe-kwa-ra nzà.

Ya mere ndi-agha ahu mere ihe ndia.

25 Ma nne-Ya, na nwa-nne nne-Ya nke nwayi, Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalini, nēguzo obe Jisus nso.

26 Ya mere mb͕e Jisus huru nne-Ya, na onye ahu nke nēso uzọ-Ya, onye Ọ huru n’anya, ka o nēguzo nso, Ọ si nne-Ya, Nwanyi, le, nwa-gi nwoke!

27 Mb͕e ahu Ọ si onye ahu nke nēso uzọ-Ya, Le, nne-gi! Site n’oge hour ahu onye ahu nke nēso uzọ-Ya we kuru ya la n’ulo nke aka ya.

28 Mb͕e ihe a gasri, Jisus, ebe Ọ matara na ihe nile agwuwo ub͕u a, ka ihe edeworo n’akwukwọ nsọ we mezu, Ọ si, Akpiri nākpọm nku.

29 Adọbara n’ebe ahu ite nke manya-vine b͕ara uka juru: ya mere ha were sponge nke manya-vine ahu b͕ara uka juru tukwasi n’elu osisi hyssop, che Ya n’ọnu.

30 Ya mere mb͕e Jisus narasiri manya-vine ahu nke b͕ara uka, Ọ siri, Ọ gwuwo O we rube isi, rara mọ-Ya nye.

31 Ya mere ndi-Ju, ebe ọ bu ubọchi Nkwadebe, ka aru-ha we ghara idigide n’elu obe n’ubọchi-izu-ike (n’ihi na ubọchi-izu-ike nke ízù ahu bu oké ubọchi), ha kpere Pailat ka etijie ogwe-ukwu-ha, ka ebupu kwa ha.

32 Ya mere ndi-agha biara, tijie ogwe-ukwu nke onye mbu, na nke onye ọzọ, nke akpọgidere Ya na ya n’obe:

33 ma mb͕e ha biaruru Jisus, hu kwa na Ọ nwuwori ub͕u a, ha etijighi ogwe-ukwu-Ya:

34 otú ọ di, otù onye n’etiti ndi-agha were ube ma Ya n’akuku, ngwa ngwa ọbara na miri we puta.

35 Onye huworo ya ab͕awo kwa àmà, àmà-ya bu kwa ezie: onye ahu nāmata kwa na o nēkwu ezi-okwu, ka unu onwe-unu we kwere kwa.

36 N’ihi na ihe ndia mere, ka ihe edeworo n’akwukwọ nsọ we mezu, Agaghi-etiji otù ọkpukpu-Ya.

37 Ọzọ kwa, ihe ọzọ di iche edeworo n’akwukwọ nsọ si, Ha gēlegide Onye ahu Nke ha mapúru amapú.

38 Ma mb͕e ihe ndia gasiri, Josef nke Arimatia, ebe o nēso uzọ Jisus, ma na nzuzo n’ihi egwu ndi-Ju, o kpere Pailat ka o bupu aru Jisus: Pailat we kwere ya. Ya mere ọ biara, bupu aru-Ya.

39 Nikọdimọs, onye biakutere Ya n’abali na mbu, bia-kwa-ra, nēweta myrrh na aloes agwara, ihe ra ka ọgu pound ise n’ọtùtù.

40 Ya mere ha were aru Jisus, ke ya n’ezi ákwà-ozu, ya na udá utọ ndia, dika ndi-Ju nēme n’ilì ozu.

41 Ma n’ebe akpọgidere Ya N’obe otù ubi ab͕ara ogige di; nime ubi ab͕ara ogige ahu ílì ọhu di kwa nke akātọb͕ọghi madu ọ bula nime ya.

42 Ya mere n’ebe ahu, n’ihi ubọchi Nkwadebe nke ndi-Ju, (n’ihi na ílì ahu di nso), ka ha tọb͕ọrọ Jisus.

Categories
JỌN

JỌN 20

1 Ma n’ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa n’isi-ututu, mb͕e chi akābọghi, Meri Magdalini biaruru ílì ahu, we hu nkume-ya na ewepuwo ya n’ílì.

2 Ya mere ọ b͕a ọsọ, biakute Saimon Pita, biakute kwa onye ọzọ ahu nēso uzọ Jisus, onye Jisus huru n’anya, si ha, Ha ebupuwo Onye-nwe-ayi n’ílì, ayi amataghi kwa ebe ha tọb͕orọ Ya.

3 Ya mere Pita puru, ya na onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus, ha we nēje iru ílì ahu.

4 Ha abua we b͕a ọsọ n’otù: onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus we b͕a kari Pita, buru uzọ biarue ílì ahu;

5 o we ruru ala nyo nime ya, hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ; otú ọ di, ọ bàghi nime.

6 Ya mere Saimon Pita bia kwa nēso ya, o we ba nime ílì ahu; o we hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ,

7 ichafọ kwa, nke diri n’isi-Ya, ya na ezi ákwà-ozu ahu atọb͕ọghi n’otù ebe, kama aturuworo ya debe n’otù ebe di iche.

8 Ya mere mb͕e ahu onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus, onye buru uzọ biarue ílì, bà-kwa-ra nime, o we hu, kwere kwa.

9 N’ihi na ha akāmataghi ihe edeworo n’akwukwọ nsọ, na Ọ ghaghi isi na ndi nwuru anwu bilie.

10 Ya mere ndi ahu ndi nēso uzọ Jisus laghachiri ọzọ n’ulo nke aka ha.

11 Ma Meri nēguzo n’èzí na nso ílì ahu nākwa ákwá: ya mere, ka ọ nākwa, o ruru ala nyo nime ílì;

12 o we hu ndi-mọ-ozi abua nēyi uwe ọcha ka ha nọduru ala, otù n’isi, otù kwa n’ukwu, n’ebe atọb͕ọrọri aru Jisus.

13 Ndi ahu we si ya, Nwanyi, gini mere i nākwa ákwá? Ọ si ha, N’ihi na ha bupuru Onye-nwem, amatakwaghm ebe ha tọb͕ọrọ Ya.

14 Mb͕e o kwusiri okwu ndia, o chigharia, we hu Jisus ka O guzoro, ma ọ mataghi na ọ bu Jisus.

15 Jisus si ya, Nwanyi, gini mere i nākwa ákwá? ònye ka i nāchọ? Nwanyi ahu, ebe ọ nēchè na Ọ bu onye-nche ubi ahu ab͕ara ogige, ọ si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na Gi onwe-gi bupuru Ya, gwam ebe I tọb͕ọrọ Ya, mu onwem gēbupu kwa ya.

16 Jisus si ya, Meri. Nwayi ahu chigharia, si Ya n’asusu Hibru, Rabonai; nke bu, Onye-ozizí.

17 Jisus si ya, Emetulam aka; n’ihi na akāmarigogh lakuru Nnam: ma gakwuru umu-nnam, si ha, Anamarigo lakuru Nnam na Nna-unu, na Chinekem na Chineke-unu.

18 Meri Magdalini bia kọrọ ndi nēso uzọ-Ya, si, Ahuwom Onye-nwe-ayi; ọkọ-kwa-ra ha otú Ọ gwara ya-ri ihe ndia.

19 Ya mere mb͕e o ruru anyasi, n’ubọchi ahu, bú ubọchi mbu n’ízù, mb͕e emechi-kwa-ra uzọ nile ebe ndi nēso uzọ-Ya nọ, n’ihi egwu ndi-Ju, Jisus biara guzo n’etiti, si ha, Udo diri unu.

20 Mb͕e O kwusiri nka, O gosi ha aka-Ya abua na akuku-Ya. Ya mere ndi nēso uzọ-Ya ṅuriri ọṅu, mb͕e ha huru Onye-nwe-ayi.

21 Ya mere Jisus siri ha ọzọ, Udo diri unu: dika Nnam ziteworom, otú a ka Mu onwem nēziga kwa unu.

22 Mgbe, ahu o kusa ha ume, si ha, Naranu Mọ Nsọ:

23 ndi nile ọ bula unu nāb͕aghara nmehie-ha, ab͕agharawo ha nye ha; ndi nile ọ bula unu nējide nmehie-ha, ejidewo nmehie-ha.

24 Ma Tomas, nke anākpọ Didimọs, otù onye nime ndi-ozi iri na abua ahu, anọghi n’etiti ha mb͕e Jisus biara.

25 Ya mere ndi ọzọ nēso uzọ Jisus si ya, Ayi ahuwo Onye-nwe-ayi. Ma ọ siri ha, Ọ buru na ahughm n’aka-Ya abua apa ǹtú, tiye kwa nkpisi-akam n’apa ǹtú ahu, tiye kwa akam n’akuku-Ya, m’gaghi-ekwe ma-ọli.

26 Mb͕e ubọchi asatọ ọzọ gasiri ndi nēso uzọ Jisus we nọ nime ulo, Tomas nọ kwa n’etiti ha. Jisus bia, mb͕e emechiri uzọ nile, O guzo n’etiti ha, si, Udo diri unu.

27 Mb͕e ahu Ọ si Tomas, Setipu nkpisi-aka-gi n’ebe a, le akam abua; setipu kwa aka-gi, tiye nime akukum: aghọ-kwa-la onye nēkweghi, kama ghọ onye nēkwere.

28 Tomas zara, si Ya, Onye-nwem na Chinekem.

29 Jisus si ya, N’ihi na i huwom, ì kwerewo? ngọzi nādiri ndi akāhughi, ma ha kwere.

30 Ya mere ọtutu ihe-iriba-ama ọzọ ka Jisus mere n’iru ndi nēso uzọ-Ya, nke anēdeghi n’akwukwọ a:

31 ma edewo ihe ndia n’akwukwọ, ka unu we kwere na Jisus bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke; ka unu we nwe kwa ndu n’aha-Ya n’ihi na unu kwere.

Categories
JỌN

JỌN 21

1 Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus mere Onwe-ya ka Ọ puta ìhè ọzọ nye ndi nēso uzọ-Ya n’oké osimiri Taibirias; ma O mere Onwe-ya ka Ọ puta ìhè otú a.

2 Saimon Pita, na Tomas anākpọ Didimọs, na Nataniel, bú onye Kena nke Galili, na umu nke Zebedi, na madu abua ọzọ nime ndi nēso uzọ-Ya, nọkọrọ n’otù ebe.

3 Saimon Pita si ha, Anamaga ib͕u azù. Ha si ya, Ayi onwe-ayi gēso kwa gi je. Ha puru, ba n’ub͕ọ-ha; ma n’abali ahu ha egbughi ihe ọ bula.

4 Ma mb͕e chi nābọ ub͕u a, Jisus guzoro n’ótú: otú ọ di, ndi nēso uzọ-Ya amataghi na ọ bu Jisus.

5 Ya mere Jisus si ha, Umu-ntakiri, ùnu ji ihe-oriri ọ bula? Ha zara Ya, si, É-è.

6 O we si ha, Wuyenu ihe unu ji eb͕u azù n’akuku aka-nri nke ub͕ọ, unu gāhu kwa. Ya mere ha wuyere ya, ma ub͕u a ha enweghi ike idọ ya n’ihi ọtutu azù di ya.

7 Ya mere onye ahu nke nēso uzọ-Ya onye Jisus huru n’anya siri Pita, Ọ bu Onye-nwe-ayi. Ya mere mb͕e Saimon Pita nuru na ọ bu Onye-nwe-ayi, o b͕okwasi uwe uku ya (n’ihi na ọ b͕ara ọtọ), we tubà onwe-ya nime oké osimiri.

8 Ma ndi ọzọ ndi nēso uzọ Jisus biara n’ub͕ọ ntà ha (n’ihi na ha anọghi n’ebe di anya n’ala, kama ihe ra ka ọgu cubit iri), nādọ ihe ha ji eb͕u azù nke azù juru nime ya.

9 Ya mere mb͕e ha ridara n’ala, ha hu ọku icheku n’ebe ahu, na azù atukwasiri ya, na ob͕e achicha.

10 Jisus si ha, Wetanu ufọdu nime azù unu b͕uru ub͕u a.

11 Ya mere Saimon Pita rigoro, dọrọ ihe ha ji eb͕u azù bia n’ala, nke oké azù juru nime ya, ọgu azù asa na iri na atọ: ma ọ bu ezie na azù di ọtutu otú a, ma ihe ha ji eb͕u azù adọkaghi.

12 Jisus si ha, Bianu, rie nri-ututu. Ma ọ dighi onye ọ bula nime ndi nēso uzọ-Ya nwere anya-ike iju Ya, si, Gì onwe-gi bu onye? n’ihi na ha matara na ọ bu Onye-nwe-ayi.

13 Jisus bia, were achicha ahu, nye ha, azù ahu kwa otú ahu.

14 Nka mere ya ub͕ò atọ emere ka Jisus puta ìhè nye ndi nēso uzọ-Ya, mb͕e emesiri ka O si na ndi nwuru anwu bilie.

15 Ya mere mb͕e ha risiri nri-ututu-ha, Jisus si Saimon Pita, Saimon, nwa Jọn, ì hurum n’anya kari ndia? Ọ si Ya, E, Onye-nwe-ayi; Gi onwe-gi matara na I bu eyìm. Ọ si ya, Nēnye umu-aturum nri.

16 Ọ si ya ọzọ nke ub͕ò abua, Saimon, nwa Jọn, ì hurum n’anya? Ọ si Ya, E, Onye-nwe-ayi; Gi onwe-gi matara na I bu eyìm. Ọ si ya, Nāzù aturum.

17 Ọ si ya nke ub͕ò atọ, Saimon, nwa Jọn, àbum eyì-gi? O wutara Pita na Ọ siri ya nke ub͕ò atọ, Àbum eyì-gi? O we si Ya, Onye-nwe-ayi, Gi onwe-gi matara ihe nile; Gi onwe-gi mara na I bu eyìm. Jisus si ya, Nēnye aturum nri.

18 N’ezie, n’ezie, asim i, Mb͕e i di n’okorọbia, i nēke onwe-gi ihe-ọkiké n’úkwù, nējeghari kwa ebe i nāchọ: ma mb͕e i gēme agadi, i gēseti aka-gi abua, onye ọzọ gēke gi ihe-ọkiké n’úkwù, būru kwa gi ga ebe i nāchọghi.

19 Ma nka ka O kwuru, nēgosi aha ọnwu ọ gēji nye Chineke otuto. Mb͕e O kwusiri nka, Ọ si ya, Som.

20 Pita we chigharia, hu onye ahu nke nēso uzọ-Ya, onye Jisus huru n’anya, ka o nēso; onye nādabere kwa n’obi-Ya na nri-anyasi ahu, si, Onye-nwe-ayi, ònye bu onye ahu nke nārara Gi nye?

21 Ya mere Pita, mb͕e ọ huru ya, ọ si Jisus, Onye-nwe-ayi, ma onye a, gini gēme ya?

22 Jisus si ya, Ọ buru na anamachọ ka ọ nọgide rue mb͕e M’gābia, ọ̀ bu gini n’ebe i nọ? gi onwe-gi som.

23 Ya mere okwu a putara n’etiti umu-nna nime Kraist, na onye ahu nke nēso uzọ-Ya agaghi-anwu: ma Jisus asighi ya, na ọ gaghi-anwu; kama, Ọ buru na anamachọ ka ọ nọgide rue mb͕e M’gābia, ọ̀ bu gini n’ebe i nọ?

24 Nka bu onye ahu nēso uzọ Jisus nke nāb͕ara ihe ndia àmà, nke de-kwa-ra ihe ndia n’akwukwọ: ayi mata-kwa-ra na àmà-ya bu ezie.

25 Ma ọtutu ihe ọzọ nke Jisus mere di kwa, nke, ma ọ buru na edere ha n’akwukwọ n’otù n’otù, ọ dim ka ọbuná uwa onwe-ya agaghi-anagide akwukwọ agēde.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 1

1 Ederem akwukwọ mbu, Teofilọs, banyere ihe nile Jisus malitere ime na izí,

2 rue ubọchi anara Ya n’elu, mb͕e O sitere na Mọ Nsọ nyesia ndi-ozi-Ya ndi Ọ rọputarari iwu:

3 ndi O ji kwa ọtutu uzọ nādighi igọ agọ che Onwe-ya n’iru ha na ndu mb͕e Ọ husiri ahuhu, ebe O mere ka ha nāhu Ya anya n’ogologo ọgu ubọchi abua, O nēkwu kwa ihe nile bayere ala-eze Chineke:

4 mb͕e Ya na ha zukọrọ O we nye ha iwu ka ha ghara isi na Jerusalem pua, kama ka ha chere nkwa nke Nna-Ya, nke unu nuru n’ọnum, ka O kwuru:

5 n’ihi na Jọn jiri miri me baptism n’ezie; ma agēji Mọ Nsọ me unu baptism mb͕e ọtutu ubọchi nāgaghi-agabiga site n’ub͕u a.

6 Ya mere mb͕e ha b͕akọrọ, ha jua Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ̀ bu n’oge a ka I nēnyeghachi Israel ala-eze?

7 O we si ha, Ọ bughi ihe diri unu ima oge ma-ọbu ubọchi, nke Nnam debere n’ike nke aka Ya.

8 Ma unu gānata ike, mb͕e Mọ Nsọ gābiakwasiwori unu: unu gābu kwa ndi-àmàmnime Jerusalem, na nime Judia na Sameria nile, ru kwa ebe uwa sọturu.

9 Mb͕e O kwusiri okwu ndia, mb͕e ha nēle anya, ewe welie Ya elu; igwe-oji we nara Ya, Ọ pua n’anya-ha.

10 Mb͕e ha nēlegide anya n’elu-igwe ka Ọ nāga n’elu, le, ndikom abua we guzo ha nso yiri uwe ọcha;

11 ndi si-kwa-ara, Ndikom nke Galili, gini mere unu nēguzo nēle anya n’elu-igwe? Jisus nka, Onye anapuru n’ebe unu nọ rigo n’elu-igwe, gābia n’otù aka ahu dika unu kiriri Ya ka Ọ nāga n’elu-igwe.

12 Mb͕e ahu ha siri n’ugwu anākpọ Olivet, nke di Jerusalem nso, ije nke otù ubọchi-izu-ike, laghachi na Jerusalem.

13 Mb͕e ha batara n’obodo, ha we rigo n’ime-ulo di n’elu ulo, ebe ha nānọ; Pita na Jọn na Jemes na Andru, Filip na Tomas, Batọlọmiu na Matiu, Jemes nwa Alfiọs, na Saimon Zilotis, na Judas nwa Jemes.

14 Ndia nile ji otù obi nọgidesi ike n’ekpere, ha na ndinyom ufọdu, na Meri nne Jisus, na umu-nne-Ya.

15 Na mb͕e ahu Pita we bilie n’etiti umu-nna nime Kraist, si, (ìgwè madu ndi nọkọrọ n’otù di kwa, ihe ra ka ọgu madu isi),

16 Umu-nnam, ihe edeworo n’akwukwọ nsọ aghaghi imezu, nke Mọ Nsọ kwuru n’oge gara aga site n’ọnu Devid banyere Judas, onye mesiri buru onye-ndù ndi jidere Jisus.

17 N’ihi na aguru ya-ri n’etiti ayi, o we keta òkè-ya n’ije-ozi a.

18 (Ya mere onye a sitere n’ugwọ-ọlu nke ajọ omume-ya nata otù iberibe ala; o we da su isi n’ala, tipue afọ-ya, ngiri-afọ-ya nile we nuputa.

19 Ọ we buru ihe ndi nile bi na Jerusalem mara; ya mere eji akpọ iberibe ala ahu Akeldama n’asusu-ha, nke ahu bu, Iberibe ala ọbara.)

20 N’ihi na edewo ya n’akwukwọ Abù ọma, si,

Ka ebe-ulo-ikwū-ya ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu,

Ka onye ọ bula ghara kwa ibi na ya: na,

Ka onye di iche nara ya ọlu-nlekọta-ya.

21 Ya mere otù onye nime ndikom ndi soro ayi n’oge nile Onye-nwe-ayi Jisus bàra nime pu kwa n’èzí n’etiti ayi,

22 nāmalite na baptism nke Jọn, rue ubọchi anapuru Ya n’ebe ayi nọ rigo n’elu-igwe, otù onye nime ndia aghaghi iso ayi buru onye-àmà nke nbilite- n’ọnwu-Ya.

23 Ha we guzo madu abua, Josef anākpọ Basabas, onye akpọ-kwa-ra Justọs, na Mataias.

24 Ha we kpe ekpere, si, Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, Onye mara obi madu nile, gosi ayi onye ahu I rọputara nime madu abua ndia,

25 inara ọnọdu n’ije-ozi na ọlu onye-ozi a, nke Judas jehiere nime ya, ka o we ga n’ebe nke aka ya.

26 Ha we fere ha nzà; nzà ahu we ma Mataias; ewe gua ya nime ndi-ozi iri na otù ahu.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 2

1 Mb͕e ubọchi Pentikọst nēzu okè, ha nile we nọkọ n’otù ebe.

2 Na mberede ùzù, dika nke oké ifufe nke nēfesi ike, we site n’elu-igwe, o we juputa ulo ahu dum ebe ha nānọdu ala.

3 Ewe me ka ha hu ire, dika nke ọku, nēkesa onwe-ha; o we nọkwasi ha nile n’otù n’otù.

4 Ha nile we juputa na Mọ Nsọ, ha we malite ikwu okwu n’asusu di iche, dika Mọ ahu nēnye ha ike ikwuwa okwu.

5 Ma ndi-Ju ufọdu bi na Jerusalem, ndi nātu egwu Chineke, ndi si na mba nile di n’okpuru elu-igwe bia.

6 Ma mb͕e ùzù ahu putura, ọra madu b͕akọrọ, o we b͕a ha ghari, n’ihi na onye ọ bula n’etiti ha nānu ka ha nēkwu okwu n’asusu nke aka ya.

7 Ibobo we nwua ha nile n’aru, o ju-kwa-ra ha anya, ha si, Le, ndia nile ndi nēkwu okwu, hà abughi ndi Galili?

8 Àyi onwe-ayi si kwa aṅa nu n’otù n’asusu nke aka ayi, nke amuru ayi nime ya?

9 Ndi Patia na ndi Midia na ndi Ilam, na ndi bi na Mesọ-pọtemia, ndi bi kwa nime Judia na Kapa-dọsia, nime Pọntọs na Esia,

10 nime Frijia na Pamafilia, nime Ijipt na akuku Libia di Sairini nso, na ndi-ọbìa si na Rom bia, ma ndi-Ju ma ndi nēso uzọ ndi-Ju,

11 ndi Krit na ndi Arebia, ayi nānu ka ha nēkwu okwu n’asusu-ayi bayere oké ọlu nile nke Chineke.

12 Ibobo we nwua ha nile n’aru, ha nwe-kwa-ra obi abua, nāsirita ibe-ha, Isi ihe a bu gini?

13 Ma ndi ọzọ nēme ha ihe-ọchì, si, Ha ṅujuworo manya-vine ọchu afọ.

14 Ma Pita guzoro, ya na ndi-ozi iri na otù ahu, we welie olu-ya elu, gwawa ha okwu, si, Ndikom nke Judia, na unu nile ndi bi na Jerusalem, maranu nka, ge-kwa-nu nti n’okwum.

15 N’ihi na manya abàghi ndia n’anya, dika unu onwe-unu nēchè; ebe ọ bu oge hour nke-atọ n’ututu;

16 kama nka bu nke ekwuworo site n’ọnu Joel onye-amuma, si,

17 Ọ gēru kwa na mb͕e ikpe-azu, ka Chineke kwuru,

M’gāwusa ufọdu nime Mọm n’aru anu-aru nile, bú madu:

Umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma,

Umu-okorọbia-unu gāhu kwa ọhù,

Ndi-okenye-unu gārọ kwa nrọ:

18 E, n’aru ndi-orùm ndikom na n’aru ndi-orùm ndinyom

Ka M’gāwusa ufọdu nime Mọ nkem na mb͕e ahu; ha gēbu kwa amuma.

19 M’gēnye kwa ọlu-ebube n’elu-igwe di n’elu,

Na ihe-iriba-ama n’elu ala di n’okpuru ya;

Ọbara, na ọku, na alulu anwuru-ọku:

20 Anyanwu gāb͕anwe ghọ ọchichiri,

Ọnwa gāb͕anwe kwa ghọ ọbara,

Tutu ubọchi Onye-nwe-ayi abia,

Bú oké ubọchi ahu nke nāputa ìhè:

21 O gēru kwa, na onye ọ bula nke gākpọku aha Onye-nwe-ayi, agāzọputa ya.

22 Ndikom nke Israel, nurunu okwu ndia: Jisus Onye Nazaret, bú Nwoke Nke Chineke gosiworo unu site n’ọlu di ike na ọlu-ebube na ihe-iriba-ama, nke Chineke mere site n’aka-Ya n’etiti unu, dika unu onwe-unu matara:

23 Onye a, ebe ewere Ya nye site n’ìzù akara àkà nke Chineke na ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara, Onye a ka unu kpọgidere n’obe b͕u kwa site n’aka ndi nāmaghi iwu-ayi:

24 Onye Chineke mere ka O si n’ọnwu bilie, mb͕e Ọ tọpusiri ihe-nb͕u nke ọnwu: n’ihi na ọnwu apughi ijide Ya.

25 N’ihi na Devid nēkwu okwu bayere Ya, si,

Anamahuri Onye-nwe-ayi n’irum mb͕e nile;

N’ihi na Ọ nọ n’aka-nrim, ka aghara ime ka M’me nkpatu:

26 N’ihi nka ọ tọrọ obim utọ, obi nātọ kwa irem utọ nke-uku;

Ọzọ kwa, anu-arum gēbi kwa n’olile-anya:

27 N’ihi na I gaghi-arapu nkpuru-obim nime Hedis,

I gaghi-enye kwa Onye nke Gi di ọcha n’obi ka Ọ hu ire-uré.

28 I mere ka M’mara uzọ ndu;

I gēji iru-Gi me ka M’juputa n’ọṅù.

29 Umu-nnam, o ziri ezi iwere nkwuwa-okwu gwa unu okwu bayere nna uku ayi Devid, na ọ nwuru, eli kwa ya, ílì-ya di kwa n’etiti ayi rue ubọchi ta.

30 Ya mere ebe ọ bu onye-amuma, mata kwa na Chineke ṅuru ya-ri iyi, na Ọ gēwere otù Onye nime ndi bu nkpuru si ya n’afọ puta me ka Ọ nọkwasi oche-eze-ya;

31 ebe o buru uzọ hu nka a o kwuru okwu bayere nbilite-n’ọnwu nke Kraist ahu, na arapughi Ya nime Hedis, anu-aru-Ya ahughi kwa ire-uré.

32 Jisus nka ka Chineke mere ka O si n’ọnwu bilie, nke ayi onwe-ayi nile bu ndi-àmà-ya.

33 Ya mere, ebe eweliri Ya elu site n’aka-nri Chineke, ebe Ọ nata-kwa-ra n’aka Nna-Ya nkwà ahu, bú Mọ Nsọ, Ọ wusara nka unu onwe-unu nāhu nānu kwa.

34 N’ihi na Devid arigoghi n’elu-igwe: ma ya onwe-ya si,

Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem, Nọdu ala n’aka-nrim,

35 Rue mb͕e M’gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi nke ukwu-Gi abua.

36 Ya mere ka ulo Israel nile mazue, na Chineke mere Ya ka Ọ buru Onye-nwe-ayi na Kraist-ayi, bú Jisus ahu Onye unu onwe-unu kpọgidere n’obe.

37 Ma mb͕e ha nuru nke a, ewe dua ha nime obi-ha, ha we si Pita na ndi-ozi fọduru, Umu-nna-ayi, gini ka ayi gēme?

38 Pita we si ha, Chègharianu, ka eme kwa unu nile baptism n’otù n’otù n’aha Jisus Kraist, ka ewe b͕aghara nmehie nile unu; unu gānata kwa onyinye a, bú Mọ Nsọ.

39 N’ihi na unu ka nkwa nka diri, na umu-unu, na ndi nile nọ n’ebe di anya, ka ha ra, bú ndi Onye-nwe-ayi Chinike-ayi gākpọtara Onwe-ya.

40 O ji kwa ọtutu okwu ọzọ kwusie okwu ike, nāriọ kwa ha, si, Zọputanu onwe-unu n’ọb͕ọ a di nb͕agọ.

41 Ya mere ndi nāra okwu-ya nke-ọma, emere ha baptism: n’ubọchi ahu ewe tukwasiri ha ihe ra ka nnù madu asa na ọgu iri.

42 Ha we nānọgidesi ike n’ozizí ndi-ozi na nnwekọ, n’inyawa-achicha-ha na ekpere-ha.

43 Madu nile we tua egwu n’otù n’otù: eme-kwa-ra ọtutu ọlu-ebube na ihe-iriba-ama site n’aka ndi-ozi.

44 Ndi nile ndi kwere na Kraist nọkọ-kwa-ra, ha nwekọ-kwa-ra ihe nile;

45 ha we re ihe nile ha natara na ihe nile ha nwere, we kesa ha nye madu nile, dika nkpà diri onye ọ bula.

46 Ha ji kwa otù obi nānọgidesi ike n’ulo uku Chineke kwa-ubọchi, ha nānyawa kwa achicha n’ulo-ha, we nara ihe-oriri-ha n’obi utọ na obi nke aghughọ nādighi ya,

47 ha nēto Chineke, ihe-ha nātọ kwa ndi-Ju dum utọ. Onye-nwe-ayi nātukwasi-kwa-ra ha kwa-ubọchi ndi anāzọputa.