Categories
ZEKARAIA

ZEKARAIA 11

1 Meghe uzọ-gi nile, gi Lebanon, ka ọku we ripia osisi cedar gi nile.

2 Kwasie ákwá ike, gi osisi fir, n’ihi na osisi cedar adawo, n’ihi na emebiwo osisi nke mab͕uru onwe-ha: kwasienu ákwá ike, unu osisi oak nke Beshan, n’ihi na oké ọhia alùgh-alù adawo.

3 Ge nti, ọ bu olu nke ikwasi-ákwá-ike nke ndi-ọzùzù-aturu! n’ihi na emebiwo ebube-ha: ge nti, ọ bu olu ib͕ọ-uja nke umu-ọdum! n’ihi na emebiwo nbili-elu nke Jọdan.

4 Otú a ka Jehova, bú Chinekem, siri: Nāzù ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u;

5 nke ndi nāzù ha nēb͕u ha, ma ikpe adighi-ama ha; ọzọ, ndi nēre ha nāsi, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, n’ihi na abum ọgaranya: ndi-ọzùzù-ha adighi-enwe ọmiko n’aru ha.

6 N’ihi na M’gaghi-enwe kwa ọmiko ọzọ n’aru ndi bi n’ala nka, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): ma, le, Mu onwem gaje irara madu ndia nye, onye ọ bula n’aka ibe-ya na n’aka eze-ya: ha gētib͕u kwa ala nka, M’gaghi-anaputa kwa ha n’aka-ha.

7 M’we zùa ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u, n’ezie ọ bu ndi ewedara n’ala nke ìgwè ewu na aturu ahu. M’we chiri n’onwem nkpa-n’aka abua; otù ka m’kpọrọ Idi-utọ, nke-ọzọ ka m’kpọrọ Ndi-ọ̀tú-udọ̀, m’we zùa ìgwè ewu na aturu.

8 M’we bipu ndi-ọzùzù-aturu atọ ahu n’otù ọnwa; nkpuru-obim enweghi kwa ntachi-obi n’aru ha, ọzọ, nkpuru-obi-ha asọwokwam oyi.

9 M’we si, M’gaghi-azù unu: nke nānwu anwu, ya nwua; nke anēbipu ebipu, ka ebipu ya; ka ndi fọduru rie, aturu ọ bula anu-aru ibe-ya.

10 M’we were nkpa-n’akam, bú Idi-utọ, b͕ujira ya abua, imebi ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ndi nile di iche iche b͕ara.

11 Ewe nyajie ya n’ubọchi ahu: otú a ndi ewedara n’ala nke ìgwè ewu na aturu ahu, bú ndi nāribam ama, we mara na okwu Jehova ka ọ bu.

12 M’we si ha, Ọ buru na ọ di nma n’anya-unu, nyenum ugwọ-ọlum; ma ọ dighi, gharanu. Ha we tùa ugwọ-ọlum, bú orú ego ọla-ọcha na iri.

13 Jehova we sim, Tufue ya nye ọkpu-ite, bú ọnu-ahia mab͕uru onwe-ya nke ha rùrum. M’we chiri orú ego ọla-ọcha na iri ahu, tufue ha nye ọkpu-ite, n’ulo Jehova.

14 M’we b͕ujira nkpa-n’akam nke-abua, bú Ndi-ọ̀tú-udọ̀, imebi nwa-nne Juda na Israel bu.

15 Jehova we sim, Were kwa n’onwe-gi ọzọ ihe nke onye-ọzùzù-aturu nke b͕agọrọ ab͕agọ n’uche-ya.

16 N’ihi na, le, Mu onwem gaje ime ka otù onye-ọzùzù-aturu bilie n’ala nka, ọ gaghi-elekọta ndi ebipuru ebipu, ọ gaghi-achọ nke achusara achusa, ọ gaghi-agwọ nke ab͕ajiri ukwu na aka; ọ gaghi-azù nke nēguzo eguzo, ma anu nke aturu mara abuba ka ọ gēri, ukwu nile ha ka ọ gānyajisi.

17 Ahuhu diri onye-ọzùzù-aturu efu nke nārapu ìgwè ewu na aturu! mma-agha gādakwasi n’ogwe-aka-ya na n’anya-ya nke aka-nri: ogwe-aka-ya gākpọsi nku, anya aka-nri ya gāhu kwa inyoghi-inyoghi nke-uku.

Categories
ZEKARAIA

ZEKARAIA 12

1 Ibu okwu Jehova eboro Israel. Ihe si n’ọnu Jehova puta, bú Onye nēseti elu-igwe, nātọ kwa ntọ-ala uwa, nākpu kwa mọ madu nime ya:

2 Le, Mu onwem gaje ime Jerusalem ka ọ ghọrọ ndi nile di iche iche ndi di ya buruburu ọkwa nṅaghari, ọ bu kwa n’aru Juda ka ọ gādi nime nnọchigide-n’agha ahu agānọchigide Jerusalem.

3 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, na M’gēme Jerusalem ka ọ ghọrọ ndi nile di iche iche nkume ebubo; ndi nile ndi ji ya ebo onwe-ha gākọwaputa onwe-ha ọnyá nke-uku; mba nile nke uwa gāchikọta kwa onwe-ha imegide ya.

4 N’ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), M’gēji ibobo tib͕ue inyinya ọ bula, ji kwa ara-ọwiwi tib͕ue onye nānọkwasi ya: ọ bu kwa ulo Juda ka M’gāsaghe anyam abua lekwasi, ọ bu inyinya nile ọ bula nke ndi nile di iche iche ka M’gēji ikpu-ìsì tib͕ue.

5 Ndi-isi nke usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Juda gāsi kwa n’obi-ha, Ume m’nwere ka ndi bi na Jerusalem gābu nime Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke-ha.

6 N’ubọchi ahu ka M’gēme ka ndi-isi nke usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Juda di ka ihe igu ọku n’etiti nkú, na dika ọwa nēnwu ọku n’etiti ùkwù-ọka; ha gēripia kwa ndi nile di iche iche di ha buruburu n’aka-nri na n’aka-ekpe: Jerusalem gēbi kwa ọzọ n’onodu-ya, obuná nime Jerusalem.

7 Jehova gēbu kwa uzọ zọputa ulo-ikwū nile nke Juda, ka ima-nma nke ulo Devid na ima-nma nke ndi bi na Jerusalem we ghara idi uku n’elu Juda.

8 N’ubọchi ahu ka Jehova gēb͕ochi ndi bi na Jerusalem; onye nāsu ngọngọ n’etiti ha n’ubọchi ahu gādi kwa ka Devid; ulo Devid gādi kwa ka Chineke, dika mọ-ozi nke Jehova n’iru ha.

9 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, na M’gāchọ ikpochapu mba nile ndi nābia imegide Jerusalem.

10 M’gāwukwasi kwa n’ulo Devid na n’aru onye bi na Jerusalem, mọ nke amara na aririọ-amara nile; ha gēlegidekwam anya, bú Onye ha mapūworo amapú: ha gēti-kwa-ra ya aka n’obi, dika madu si eti-kwa-ra nwa-nwoke amuru nání ya aka n’obi, obi-ha gēlu kwa ilu bayere ya, dika onye obi-ya nēlu ilu bayere nwa o buru uzọ mu.

11 N’ubọchi ahu oké otiti-aka-n’obi gādi na Jerusalem, dika otiti-aka-n’obi nke Hedad-rimon nime ndagwurugwu Megidon.

12 Ala nka gēti kwa aka n’obi, ab͕uru ọ bula iche; ab͕uru ulo Devid iche, na ndinyom-ha iche; ab͕uru ulo Netan iche, na ndinyom-ha iche;

13 ab͕uru ulo Livai iche, na ndinyom-ha iche; ab͕uru ndi Shimai iche, na ndinyom-ha iche;

14 ab͕uru nile ndi fọduru, ab͕uru ọ bula iche, na ndinyom-ha iche.

Categories
ZEKARAIA

ZEKARAIA 13

1 N’ubọchi ahu isi-iyi gādi nke ghere oghe nye ulo Devid, nye kwa ndi bi na Jerusalem, bayere nmehie baye-kwa-ra ọrurú.

2 Ọ gēru kwa n’ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), na M’gēbipu aha nile nke arusi nile n’ala nka, agaghi-echeta kwa ha ọzọ: ọzọ kwa, M’gēme ka ndi-amuma na mọ nke iru-árú si n’ala nka gabiga.

3 Ọ gēru kwa, mb͕e onye ọ bula gēbu kwa amuma ọzọ, na nna-ya na nne-ya ndi muru ya gāsi ya, I gaghi-adi ndu; n’ihi na okwu-ugha ka i kwuworo n’aha Jehova: nna-ya na nne-ya ndi muru ya gāmapú ya mb͕e o nēbu amuma.

4 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, na ihere gēme ndi-amuma, onye ọ bula n’ọhù-ya, mb͕e o nēbu amuma; ha agaghi-eyiri kwa uwe-nwuda nke aji-anu ka ha we ghọ aghughọ:

5 ma ọ gāsi, Ọ dighi onye-amuma m’bu, onye-ọlu-ubi ka m’bu; n’ihi na madu mere ka ab͕atam site na mb͕e m’di na nwata.

6 Agāsi kwa ya, Gini bu ntiputa-ọnyá ndia n’etiti aka-gi abua? Ọ gāsi kwa, Ha bu ọnyá etiputaram n’ulo ndi nāhum n’anya.

7 Teta, gi mma-agha, imegide Onye-ọzùzù-aturum, na imegide nwoke ahu nke bu ibem, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta): tib͕ue Onye-ọzùzù-aturu ahu, agāb͕asa kwa ìgwè ewu na aturu; M’gēchighari kwa akam imegide ndi ntà.

8 Ọ gēru kwa, n’ala nka nile, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na uzọ abua nime ya ka agēbipu, ha kubìe ume; ma uzọ nke-atọ gāfọdu nime ya.

9 M’gēme kwa ka uzọ nke-atọ ba n’ọku, M’gānucha kwa ha dika esi anucha ọla-ọcha, nwa ha dika esi anwa ọla-edo: ndi ahu gākpọku aham, Mu onwem gāza kwa ha: M’gāsi, Ndi nkem ka ọ bu; ndi ahu gāsi kwa, Jehova bu Chinekem.

Categories
ZEKARAIA

ZEKARAIA 14

1 Le, otù ubọchi nābiara Jehova, mb͕e agēkesa ihe-nkwata-gi n’etiti gi.

2 M’gāchikọta kwa mba nile ibuso Jerusalem agha; agēwere kwa obodo a, punara ya ulo-ya nile, merua ndinyom-ya: nkera obodo a gāpu buru ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, ma agaghi-ebipu ndi nka fọduru n’obodo a.

3 Jehova gāpu kwa, buso mba ahu nile agha, dika n’ubọchi O buru agha n’ubọchi ilu-ọ̀gù.

4 Ukwu-Ya abua gēguzo kwa n’ubọchi ahu n’elu ugwu Olive, nke di n’iru Jerusalem n’Iru-anyanwu, ugwu Olive gāb͕awa kwa n’etiti abua ya n’akuku Ọwuwa-anyanwu na n’akuku Ọdida-anyanwu, oké ndagwurugwu di uku ewe di; nkera ugwu ahu gāpuzuga n’akuku Ugwu, nkera-ya n’akuku Ndida.

5 Unu gēsi kwa na ndagwurugwu ugwum nile b͕alaga; n’ihi na ndagwurugwu ugwu ahu gēru Eze: e, unu gāb͕alaga, dika unu siri n’iru ala-ọma-jijiji b͕alaga n’ubọchi Uzaia, bú eze Juda: Jehova, bú Chinekem, gābia kwa, ndi nsọ nile gēsoro Gi.

6 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, na ìhè agaghi-adi, ìhè nēnwu enwu gāb͕achi:

7 ma ọ gābu otù ubọchi nke Jehova mara: ọ bughi ehihie, ọ bughi kwa abali: ma o gēru, na ìhè gādi na mb͕e anyasi.

8 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, na miri nēnye ndu gēsi na Jerusalem rùputa; nkera-ha gērùga n’oké osimiri Iru-anyanwu, nkera-ha gērùga kwa n’oké osimiri Ọdida-anyanwu: na mb͕e okpom-ọku na na mb͕e oyi ka ọ gadi.

9 Jehova gāghọ kwa eze elu-uwa nile: n’ubọchi ahu ka Jehova gādi otù, aha-Ya gādi kwa otù.

10 Ala nka nile gāghọ ihe di ka Araba, site na Geba rue Rimon na Ndida Jerusalem: agēbuli kwa ya elu, ọ gēbi kwa n’ọnọdu-ya, site n’ọnu-uzọ-ama Benjamim rue ebe ọnu-uzọ-ama mbu, rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku, site kwa n’ulo-elu Hananel rue ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile nke eze.

11 Agēbi kwa nime ya, nwezuga ka ebibie ya agaghi-adi kwa ọzọ; Jerusalem gēbi kwa na ntukwasi-obi.

12 Nka gābu kwa ihe-otiti nke Jehova gēji ti ndi nile di iche iche ndi busoworo Jerusalem agha: anu-aru-ha nile n’otù n’otù gātasi ata mb͕e ha onwe-ha nēguzo n’ukwu-ha, anya-ha gātasi kwa ata n’oghere-ha, ire-ha gātasi kwa ata n’ọnu-ha.

13 Ọ gēru kwa, n’ubọchi ahu, na oké ọb͕ub͕a-aghara nke Jehova gādi n’etiti ha; ha gējide kwa, onye ọ bula o jide ibe-ya aka, aka-ya gēbili kwa imegide aka madu-ibe-ya.

14 Ọzọ, Juda gēbuso kwa Jerusalem agha; agēkpokọta kwa àkù mba nile di buruburu, bú ọla-edo na ọla-ọcha na uwe bara uba nke-uku.

15 Otú a ka ihe-otiti nke inyinya na inyinya mule na camel na inyinya-ibu na anumanu ọ bula nke gādi n’ulo-ikwū ndia gādi, dika ihe-otiti a.

16 Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke fọduru n’etiti mba nile ndi nābia imegide Jerusalem gārigo kwa-arọ ikpọ isi ala nye Eze, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, na ime ememe ulo-ntu.

17 Ọ gēru kwa, na ab͕uru ọ bula n’etiti ab͕uru nile nke uwa nke nādighi-arigota na Jerusalem ikpọ isi ala nye Eze, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, miri agaghi-ezokwasi ha.

18 Ọ buru kwa na ab͕uru Ijipt adighi-arigobata, ọ̀ gaghi-adi n’aru ha, bú ihe-otiti, nke Jehova gēji ti mba nile ndi nādighi-arigo ime ememe ulo-ntu?

19 Nka gābu ahuhu-nmehie nke Ijipt, na ahuhu-nmehie nke mba nile ndi nādighi-arigo ime ememe ulo-ntu.

20 N’ubọchi ahu ka IHE NSỌ JEHOVA NWERE gādi n’elu ataṅu nile nke inyinya; ite nile n’ulo Jehova gādi kwa ka ọkwa-nwusa di n’iru ebe-ichu-àjà.

21 E, ite ọ bula nke di na Jerusalem, ma-ọbu nke di na Juda, gābu ihe nsọ Jehova nke usu nile nke ndi-agha nwere: ndi nile ndi nāchu àjà gābia kwa chiri ufọdu nime ha, sie ihe nime ha: ọ dighi kwa onye Kenean gādi ọzọ n’ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha n’ubọchi ahu.