Categories
ZEKARAIA

ZEKARAIA 1

1 N’ọnwa nke-asatọ, n’arọ nke-abua nke Daraiọs, ka okwu Jehova ruru Zekaraia nwa Berekaia, nwa Ido, bú onye-amuma, nti, si,

2 Jehova ewesawo nna-unu-hà oké iwe.

3 I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Laghachikutenum, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M’gālaghachikute kwa unu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

4 Unu adila ka nna-unu-hà, ndi ndi-amuma mbu kpọrọ òkù, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Biko, sinu n’uzọ ọjọ nile unu, na n’omume ọjọ nile unu, lata: ma ha anughi, ha aṅaghkwam nti; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

5 Nna-unu-hà, òle ebe ha nọ? ndi-amuma kwa, ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka ha nādi ndu?

6 Ma otú ọ di, okwum nile na ukpurum nile nke M’nyere ndi-orùm, bú ndi-amuma, n’iwu, hà erughi nna-unu-hà aru? ha we chigharia, si, Dika Jehova nke usu nile nke ndi-agha zubere ime ayi, dika uzọ nile ayi si di, na dika omume nile ayi si di, otú a ka O mesoworo ayi.

7 N’ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nke-iri-na-otù, nke ahu bu ọnwa Shebat, n’arọ nke-abua nke Daraiọs, okwu Jehova we rue Zekaraia nwa Berekaia, nwa Ido, bú onye-amuma, nti, si,

8 Ahurum n’abali, ma, le otù onye nke nānọkwasi inyinya nācha uhie uhie, onye ahu nēguzo kwa n’etiti osisi myrtle nke di n’ebe miri emi; n’azu ya ka inyinya di iche iche guzoro, nke nācha uhie uhie, na nke nācha dika manu, na nke nācha ọcha.

9 M’we si, Ǹdia bu gini, onye-nwem? Mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu sirim, Mu onwem gēme ka i hu ihe ndia bu.

10 Onye ahu nke nēguzo n’etiti osisi myrtle we za, si, Ndia bu ndi Jehova ziteworo ijeghari n’uwa.

11 Ha we za mọ-ozi nke Jehova nke nēguzo n’etiti osisi myrtle, si, Ayi ejeghariwo n’uwa, ma, le, uwa nka nile nànọdu du, di jū.

12 Mọ-ozi nke Jehova we za, si, Jehova nke usu nile ndi-agha, rùe ole mb͕e ka Gi onwe-gi nāgaghi-emere Jerusalem na obodo Juda nile ebere, bú nke I wesaworo oké iwe ọgu arọ atọ na iri ndia?

13 Jehova we za mọ-ozi nke nāgwam okwu okwu ọma di iche iche, bú okwu nkasi-obi.

14 Mọ-ozi nke nāgwam okwu we sim, Kpọsa, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ekwoworom Jerusalem na Zaion oké ekworo.

15 Ọ bu kwa iwe uku ka Mu onwem nēwesa mba nile ndi nọ jū: n’ihi na Mu onwem were iwe nke-ntà, ma ha onwe-ha yere aka ime ha ihe ọjọ.

16 N’ihi nka ka Jehova siri otú a: Ejiwom obi-ebere nile laghachikute Jerusalem; agēwu ulom nime ya, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), agēseti kwa eriri-ọtùtù n’elu Jerusalem.

17 Kpọsa ọzọ, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Obodom nile gēsite n’ezi ihe b͕asa ọzọ; Jehova gākasi kwa Zaion obi ọzọ, rọputa Jerusalem ọzọ.

18 M’we welie anyam abua, hu, ma le, mpi anọ.

19 M’we si mọ-ozi nke nāgwam okwu, Ìhe ndia bu gini? Ọ we zam, Ndia bu mpi ahu nke sọsaworo Juda na Israel na Jerusalem.

20 Jehova we me ka m’hu ndi-ọ̀kà anọ.

21 M’we si, Gini ka ndia nābia ime? O kwue, si, Ndia bu mpi ndi sọsara Juda, onye ọ bula we ghara iweli isi-ya: ma ndia abiawo ime ka ha ma jijiji, ituda mpi nile nke mba nile, ndi buliri mpi-ha imegide ala Juda isọsa ya.

Categories
ZEKARAIA

ZEKARAIA 2

1 M’we welie anyam, hu, ma le, otù onye nke eriri-ọtùtù di n’aka-ya.

2 M’we si, Òle ebe gi onwe-gi nēje? Ọ sim, Itù Jerusalem, ihu ka obosara-ya ra, na ka ogologo-ya ra.

3 Ma, le, mọ-ozi nke nagwām okwu nāpu, mọ-ozi ozọ nāpu kwa izute ya,

4 si ya, B͕a ọsọ, gwa nwa-okorọbia nka okwu, si, N’obodo di iche iche nēnweghi mb͕idi ka Jerusalem gēbi, site n’iba-uba madu na anumanu di nime ya.

5 N’ihi na Mu onwem gāburu ya mb͕idi ọku buruburu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ọ bu kwa ebube ka M’gāghọ n’etiti ya.

6 Éwù, éwù, sinu n’ala Ugwu b͕alaga, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): n’ihi na dika ifufe anọ nke elu-igwe ka M’chusaworo unu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

7 Éwù, gi Zaion, wepuga onwe-gi, gi nwanyi nke gi na ada Babilon nēbi.

8 N’ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ bu mb͕e nsọpuru gasiri ka O ziworom jekuru mba nile ndi nākwata unu: n’ihi na onye nēmetu unu aka nēmetu nwa-anya-Ya.

9 N’ihi na, le, M’gaje ifeghari akam n’aru ha, ha gābu-kwa-ra ndi nēfè ha ihe-nkwata: unu ewe mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezitewom.

10 Tie nkpu ọṅù, ṅuria, gi ada Zaion: n’ihi na, le, Mu nābia, M’gēbi kwa n’etiti gi; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

11 Ọtutu mba gārapa-kwa-ra na Jehova n’ubọchi ahu, ghọ-kwa-ram otù ndi: M’gēbi kwa n’etiti gi, i we mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute gi.

12 Jehova gēketa kwa Juda n’òkè-Ya n’elu ala nsọ a, rọputa kwa Jerusalem ọzọ.

13 Dere du, unu anu-aru nile, n’iru Jehova: n’ihi na O siwo n’ebe-obibi-Ya di nsọ teta.

Categories
ZEKARAIA

ZEKARAIA 3

1 Ọ we me ka m’hu Joshua, bú onye-isi-nchu-àjà, ka ọ nēguzo n’iru mọ-ozi nke Jehova, na Setan, ka o nēguzo n’aka-nri-ya imegide ya.

2 Jehova we si Setan, Jehova basiere gi nba ike, Setan; e, Jehova Nke rọputaworo Jerusalem basiere gi nba ike: onye a, ọ̀ bughi ọlọkọ-ọku alọputara n’ọku?

3 Ma Joshua nēyi uwe rusiri inyi, guzo n’iru mọ-ozi ahu.

4 O we za, gwa ndi nēguzo n’iru ya okwu, si, Chizuga uwe rusiri inyi n’aru ya. O we si ya, Le, emewom ka ajọ omume-gi si n’aru gi gabiga, M’gēyibe kwa gi uwe ememe.

5 M’we si, Ka ha kukùa ákwà-nkukù-isi nwuru enwu n’isi-ya. Ha we kee akwa nkechi-isi nwuru enwu n’isi-ya, yibe ya uwe; mọ-ozi Jehova nēguzo kwa n’ebe ahu.

6 Mọ-ozi nke Jehova we b͕ara Joshua àmà nke-uku, si,

7 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ buru na i je ije n’uzọm nile, ọ buru kwa na i debe ihe-ndebem, ọ gābu kwa na gi onwe-gi gēkpe ulom ikpe, ọzọ, i gēdebe kwa ogigem nile, M’gēnye kwa gi ebe-njeghari di iche iche n’etiti ndia nēguzo n’ebe a.

8 Biko, nuru, gi Joshua, bú onye-isi-nchu-àjà, gi onwe-gi na ndi-ibe-gi ndi nānọdu ala n’iru gi; n’ihi na ndi bu ihe-ebube ka ha bu: n’ihi na, le, M’gaje ime ka orùm, bú Ihe-opupú ahu, puta ìhè.

9 N’ihi na, le, nkume ahu nke M’tiyeworo n’iru Joshua; n’elu otù nkume ka anya asa di: le, M’gēb͕u eb͕ub͕u-ya, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), M’gēbupu kwa ajọ omume ala ahu n’otù ubọchi.

10 N’ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ka unu gākpọbata, onye ọ bula ọ kpọbata madu-ibe-ya, n’okpuru osisi vine na n’okpuru osisi fig.

Categories
ZEKARAIA

ZEKARAIA 4

1 Mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu we biaghachi, kpọtem, dika onye anākpọte n’ura-ya.

2 O we sim, Gini ka gi onwe-gi nāhu? M’we si, Ahuwom, ma, le, ihe-idọba-oriọna, nke bu nání ọla-edo ọla-edo, ya na ọkwa-ya n’isi-ya, na oriọna asa n’elu ya: ihe asa eji ab͕aye manu diri oriọna nile n’otù n’otù, bú nke di n’isi-ya:

3 osisi olive abua di kwa n’akuku ya, otù n’aka-nri ọkwa ahu, na otù n’aka-ekpe-ya.

4 M’we za, gwa mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu, si, Ndia bu gini, onye-nwem?

5 Mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu we za, sim, Ì maghi ihe ndia bu? M’we si, É-è, onye-nwem.

6 O we za, gwam okwu, si, Nka bu okwu Jehova nke Ọ gwara Zerubabel, si, Ọ bughi site n’usu-ndi-agha, ọ bughi kwa site n’ike, kama ọ bu site na Mọm, ka Jehova nke usu-ndi-agha siri.

7 Ònye ka i bu, gi oké ugwu? n’iru Zerubabel i gāghọ ebe di lari: ọ gēweputa kwa nkume nke-elu n’itiri ya oké nkpu, si, Amara, amara.

8 Okwu Jehova we ruem nti, si,

9 Aka abua nke Zerubabel atọwo ntọ-ala nke ulo a, aka-ya abua gēwubì kwa ya; i we mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute unu.

10 N’ihi na ònye ledaworo ubọchi ihe ntà anya? n’ihi na ha gāṅuri ọṅu, hu nkume eji atù mb͕idi n’aka Zerubabel, bú asa ndia, ndi bu anya Jehova; ndi ahu nējeghari n’uwa nile.

11 M’we za, si ya, Gini bu osisi olive abua ndia nke di n’aka-nri ebe-idọba-oriọna nka na n’aka-ekpe-ya?

12 M’we za nke ub͕ò abua, si ya, Gini bu ngalaba abua nke osisi olive ndia nke nēsi n’ihe ọla-edo abua eji ab͕apu manu b͕apu manu ọla-edo n’onwe-ha?

13 O we gwam okwu, si, I maghi ihe ndia bu? M’we si, É-è, onye-nwem.

14 Ọ si, Ndia bu umu-ndikom abua nke manu ọhu, ndi nēguzo n’akuku Onye-nwe uwa nka nile.

Categories
ZEKARAIA

ZEKARAIA 5

1 M’we welie anyam abua ọzọ, hu, ma le, akwukwọ-npiakọta nke nēfe efe.

2 O we sim, Gini ka gi onwe-gi nāhu? M’we za, Mu onwem nāhu akwukwọ-npiakọta nēfe efe; ogologo-ya di orú cubit, obosara-ya di kwa cubit iri.

3 O we sim, Nka bu ọb͕ub͕a-iyi nke nāpùru iru ala nka nile: n’ihi na onye ọ bula nke nēzu ori ka agēkpochapu n’ebe a dika o si di; ọ bu kwa onye ọ bula nke nāṅu iyi ka agēkpochapu n’ebe a dika o si di.

4 Emewom ka ọ puta, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ọ gābà kwa n’ulo onye-ori na n’ulo onye ji aham aṅu iyi ugha: ọ gānọ kwa ọnọdu-abali n’etiti ulo-ya, me ka ọ gwusia, ya na osisi-ya na nkume-ya nile.

5 Mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu we puta, sim, Biko, welie anya-gi abua, hu ihe ọ bu, bú ihe a nke nāpu apu.

6 M’we si, Gini ka ọ bu? Ọ si, Nka bu ihe-ọtùtù ephah nke nāpu apu. O we si, Nka bu oyiyi-ha n’ala nka nile:

7 (ma le, otù buruburu opù anēbuli ebuli:) nka bu kwa otù nwanyi nke nānọdu n’etiti ephah ahu.

8 O we si, Nka bu Nmebi-iwu; o we tubà ya n’etiti ephah ahu: o we tukwasi nkume opù ahu n’ọnu-ya.

9 M’we welie anyam abua, hu, ma le, ndinyom abua nāputa, ifufe di kwa na nkù-ha, n’ihi na ha nwere nkù abua dika nkù ub͕ala: ha we bulie ephah ahu n’etiti ala na elu-igwe.

10 M’we si mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu, Òle ebe ka ndia nēbuga ephah ahu?

11 O we sim, Iwuru ya ulo n’ala Shaina: mb͕e edozisiri ya, agādọba ya n’ebe ahu n’ihe-ndọkwasi-ya.

Categories
ZEKARAIA

ZEKARAIA 6

1 M’we welie anyam abua ọzọ, hu, ma le, ub͕ọ-ala anọ nēsi n’etiti ugwu abua puta; ugwu ahu bu ugwu ọla.

2 N’ub͕ọ-ala mbu ka inyinya nācha uhie uhie di; n’ub͕ọ-ala nke-abua ka inyinya nēji nji di;

3 n’ub͕ọ-ala nke-atọ ka inyinya nācha ọcha di; n’ub͕ọ-ala nke-anọ ka inyinya turu agwa nwe-kwa-ra ume di.

4 M’we za, si mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu, Gini bu ndia, onye-nwem?

5 Mọ-ozi ahu we za, sim, Ndia bu ifufe anọ nke elu-igwe, ndi nēsi n’iguzo onwe-ha n’iru Onye-nwe uwa nka nile pua.

6 Ub͕ọ-ala ahu nke inyinya nēji nji di nime ya nāpuru ala Ugwu; nke nācha ọcha puso-kwa-ra ha; nke turu agwa puru-kwa-ra ala Ndida.

7 Inyinya nwere ume pu-kwa-ra, chọ ije ka ha we jegharia n’uwa: o we si, J nu, jegharia n’uwa. Ha we jegharia n’uwa.

8 O we kpọsiem òkù ike gwam okwu, si, Le, Ndi ahu nke nāpu rue ala Ugwu emewo ka Mọm zue ike n’ala Ugwu.

9 Okwu Jehova we ruem nti, si,

10 Nara ihe n’aka ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, bú n’aka Heldai, na n’aka Tobaija, na n’aka Jedaia; gi onwe-gi bia kwa n’ubọchi ahu, bata n’ulo Josaia nwa Zefanaia, bú nke ha biaruworo site na Babilon;

11 e, nara ọla-ọcha na ọla-edo, kpua okpu-eze, kpube n’isi Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà;

12 gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, Le, otù onye nke Ihe-opupú bu aha-ya; ọ bu kwa n’ọnọdu-ya ka ọ gēsi pú, ọ gēwu kwa ulo uku Jehova:

13 ọbuná ya onwe-ya gēwu ulo uku Jehova; ọ bu kwa ya onwe-ya gēburu ebube nile, nọdu nāchi n’oche-eze-ya; otù onye-nchu-àjà gādi kwa n’oche-eze-ya: ndum-ọdu udo gādi kwa n’etiti ha abua.

14 Okpu-eze ahu gādiri Hilem, di-kwa-ra Tobaija, di-kwa-ra Jedaia, di-kwa-ra Hen nwa Zefanaia, ibu ihe-ncheta n’ulo uku Jehova.

15 Ndi nọ n’ebe di anya gābia kwa, wue n’ulo uku Jehova, unu ewe mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute unu. Ọ gēme kwa, ọ buru na unu ege olu Jehova, bú Chinek-unu, nti nke-ọma.

Categories
ZEKARAIA

ZEKARAIA 7

1 O rue, n’arọ nke-anọ nke Daraiọs, bú eze, na okwu Jehova ruru Zekaraia nti, n’ubọchi nke-anọ nke ọnwa nke-iteghete, n’ọnwa Kislev.

2 Ma ndi Bet-el zigarari Shareza na Regem-melek na ndi-ha ime ka iru Jehova dajua,

3 na igwa ndi-nchu-àjà ndi diri ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha okwu, ha na ndi-amuma, si, M’gākwa ákwá n’ọnwa nke-ise, nēkewaputa onwem, dika m’meworo otutu aro ra ka ndia?

4 Okwu Jehova nke usu nile nke ndi-agha we ruem nti, si,

5 Gwa ndi nile nke ala nka, gwa kwa ndi-nchu-àjà, okwu, si, Mb͕e unu buru ọnu, mb͕e unu tiri aka n’obi n’ọnwa nke-ise, na n’ọnwa nke-asa, ọbuná ọgu arọ atọ na iri ndia, ọ̀ bu obubu-ọnu unu buru ma-ọli nye Mu onwem?

6 Ọzọ, mb͕e unu nēri ihe, ma-ọbu mb͕e unu nāṅu ihe-ọṅuṅu, ọ̀ bughi unu onwe-unu bu ndi nēri ihe? ọ̀ bughi kwa unu onwe-unu bu ndi nāṅu ihe-ọṅuṅu?

7 Ùnu agaghi-anu okwu nile nke Jehova kpọsaworo site n’aka ndi-amuma mbu, mb͕e Jerusalem bu ebe madu bi, mb͕e ọ nọ kwa n’udo, mb͕e madu bi kwa n’obodo-ya nile di ya buruburu na nime Negeb na n’ebe di ala ala?

8 Okwu Jehova we rue Zekaraia nti, si,

9 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, Kpenu ikpe ezi-okwu, nwe-kwa-nu ebere na obi-ebere nile, onye ọ bula n’aru nwa-nne-ya:

10 unu emeb͕u-kwa-la nwanyi di-ya nwuru, na nwa-nb͕ei, na ọbìa, na onye ewedara n’ala; unu echè-kwa-la ihe ọjọ n’obi-unu, onye ọ bula megide nwa-nne-ya.

11 Ha we ju iṅa nti, wezuga ubu-ha, me ka nti-ha di arọ́, ka ha we ghara inu ihe.

12 Ọ bu kwa obi-ha ka ha mere ka ha ghọ nkume adamant, ka ha we ghara inuru iwu Chineke, na okwu nile nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha zitere site na Mọ-Ya site n’aka ndi-amuma mbu: oké iwe we site na Jehova nke usu nile nke ndi-agha bia.

13 O rue na, dika Ọ kpọrọ òkù, ma ha anughi; otú a ka ha gākpọ òkù, ma M’gaghi-anu; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri;

14 ma M’gēfesa ha dika oké ifufe n’etiti mba nile ndi ha nāmaghi. Ala nka we tọb͕ọrọ n’efu n’azu ha, ghara inwe onye-ngabiga ma-ọbu onye nālata: n’ihi na ha mere ala anāchọsi ike ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu.

Categories
ZEKARAIA

ZEKARAIA 8

1 Okwu Jehova nke usu nile nke ndi-agha we bia, si,

2 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ekwoworom Zaion oké ekworo, ejiwokwam oké ọnuma kworo ya ekworo.

3 Otú a ka Jehova siri: Alaghachiwom na Zaion, M’gēbi kwa n’etiti Jerusalem: agākpọ kwa Jerusalem Obodo ezi-okwu; agākpọ kwa ugwu nke Jehova nke usu nile ndi-agha Ugwu nsọ.

4 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Agadi ndikom na agadi ndinyom gānọdu ala ọzọ n’amá nile nke Jerusalem, onye ọ bula o jide nkpa-n’aka-ya n’aka-ya site n’iba-uba nke ubọchi ndu-ya.

5 Amá nile nke obodo ahu gējuputa kwa n’umu-ntakiri ndikom na umu-ntakiri ndinyom nēgwuri egwú n’amá-ya nile.

6 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Asi na ọ dikari ike ime n’anya ndi nka fọduru n’ubọchi ahu, ọ̀ bu kwa n’anyam ka ọ gādi kari ike ime? (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta).

7 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Le, M’gaje izọputa ndim n’ala Ọwuwa-anyanwu, na n’ala Ọdida-anyanwu:

8 M’gēme kwa ka ha bia, ha gēbi kwa n’etiti Jerusalem: ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke, n’ezi-okwu na n’ezi omume.

9 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ka aka-unu di ike, unu ndi nānu n’ubọchi ndia okwu ndia n’ọnu ndi-amuma ahu, ndi nọ n’ubọchi mb͕e atọrọ ntọ-ala ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú ulo uku Ya, ka ewe wue ya.

10 N’ihi na tutu ubọchi nile ahu ugwọ-ọlu madu adighi, ugwọ-ọlu anumanu adighi kwa; ọ dighi kwa udo diri onye nāpu apu ma-ọbu onye nābata abata site n’onye-nkpab͕u: eziga-kwa-ram madu nile, onye ọ bula imegide ibe-ya.

11 Ma ub͕u a ọ bughi dika n’ubọchi mbu nile ka Mu onwem gādiri ndi nka fọduru; (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta).

12 N’ihi na nkpuru udo gādi; osisi vine gāmi nkpuru-ya, ala ēme kwa ihe-ọmume-ya, elu-igwe gēnye igirigi-ha; M’gēme kwa ka ndi nka fọduru keta ihe ndia nile.

13 Ọ gēru kwa na, dika unu buri nkọcha n’etiti mba nile, unu ulo Juda na ulo Israel, otú a ka M’gāzọputa unu, unu aburu ngọzi: unu atula egwu, kama ka aka-unu di ike.

14 N’ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Dika M’zubere ime unu ihe ọjọ, mb͕e nna-unu-hà kpasurum iwe, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ma echègharighm uche:

15 otú a ka M’zubewo-kwa-ra ọzọ n’ubọchi ndia ime Jerusalem, ime kwa ulo Juda, nma: unu atula egwu.

16 Ndia bu ihe unu gēme; Kwuenu, onye ọ bula ọ gwa ibe-ya, ezi-okwu; Kpenu ikpe ezi-okwu na ikpe udo n’ọnu-uzọ-ama nile unu:

17 unu echè-kwa-la ihe ọjọ n’obi-unu, onye ọ bula megide ibe-ya; unu ahu-kwa-la ọb͕ub͕a-iyi ugha n’anya: n’ihi na ihe ndia nile bu ihe nke M’kpọworo asì; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

18 Okwu Jehova nke usu nile nke ndi-agha we ruem nti, si,

19 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Obubu-ọnu nke ọnwa nke-anọ, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-ise, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-asa, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-iri, gāghọrọ ulo Juda obi-utọ na ọṅù, na mb͕e akara àkà di nma; hu-kwa-nu ezi-okwu na udo n’anya.

20 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ gēru kwa ọzọ na ndi di iche iche na ndi bi n’ọtutu obodo gābia:

21 ndi bi n’otù obodo gējekuru kwa obodo ọzọ, si, Ka ayi jisie ike je ime ka iru Jehova dajua, na ichọ Jehova nke usu nile nke ndi-agha: m’gēje, ọbuná mu onwem.

22 E, ọtutu ndi di iche iche na mba di iche iche di ike gābia ichọ Jehova nke usu nile nke ndi-agha nime Jerusalem, na ime ka iru Jehova dajua.

23 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Na mb͕e ahu ka ndikom iri gēsi n’asusu nile nke mba nile jide, ọbuná ijide ọnu-ọnu-ala uwe nwoke bu onye-Ju, si, Ayi na unu gāyikọ je, n’ihi na ayi anuwo na Chineke nọyere unu.

Categories
ZEKARAIA

ZEKARAIA 9

1 Ibu okwu Jehova nke eboro ala Hadrak, Damaskọs gābu kwa ebe-izu-ike-ya: n’ihi na n’ebe Jehova nọ ka anya madu na nke mba nile nke Israel di:

2 na Hemat nke nwe-kwa-ra ókè-ala-ya: Taia na Zaidon, n’ihi na ọ mara ihe nke-uku.

3 Taia we wuere onwe-ya ebe ewusiri ike, tukọba ọla-ọcha dika ájá, na ọla-edo ọma dika apiti nke amá.

4 Le, Onye-nwe-ayi gānapu ya ala-ya, tikue ike-ya n’oké osimiri, ọ bu kwa ya onwe-ya ka ọku gēripia.

5 Ashkelon gāhu ya, tua egwu; Geza kwa, ọ gāb͕ali kwa nke-uku; Ekron kwa, n’ihi na ihere gēme ntukwasi-obi-ya: eze gālanari kwa Geza n’iyi, madu agaghi-ebi kwa n’Ashkelon.

6 Nwa iko gēbi kwa n’Ashdod, M’gēbipu kwa npako ndi Filistia.

7 M’gēwezuga kwa ọbara nile ya n’ọnu-ya, wezuga kwa ihe-árú-ya nile n’etiti ezé-ya; ọ gāfọdu-kwa-ra Chineke-ayi, ọbuná ya onwe-ya: ọ gādi kwa ka otù onye-isi nke nnù madu abua na ọgu iri nime Juda, Ekron gādi kwa ka onye Jebus.

8 M’gāma-kwa-ra ulom ulo-ikwū, dika ebe-nguzo-ndi-agha, n’ihi onye-ngabiga na n’ihi onye nālata: ka onye nāchi n’ihe-ike we ghara igabiga kwa n’akuku ha ọzọ: n’ihi na ub͕u a ka M’jiworo anyam abua hu.

9 Tegharia egwú ọṅù nke-uku, gi ada Zaion; tie nkpu, gi ada Jerusalem: le, eze-gi nābiakute gi: onye ezi-omume na onye nwere nzọputa ka ọ bu; onye ewedara n’ala, nke nānọkwasi kwa n’inyinya-ibu, ọbuná na nwa-inyinya, bú nwa-inyinya-ibu.

10 M’gēbipu kwa ub͕ọ-ala n’Efraim, bipu kwa inyinya na Jerusalem, agēbipu kwa uta agha; Ọ gāgwa kwa mba nile okwu udo:Ọ gāchi kwa achi site n’otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ, site kwa n’Osimiri rue nsọtu nile nke uwa.

11 Gi onwe-gi kwa, n’ihi ọbara ọb͕ub͕a-ndu-gi ka M’zipuworo ndi-nkpọrọ-gi n’olùlù nke miri nādighi nime ya.

12 Laghachinu n’ebe ewusiri ike, unu ndi-nkpọrọ nke olile-anya ahu: ọbuná ta ka M’nēgosi na ọ bu okpukpu abua ka M’gēnyeghachi gi.

13 N’ihi na azọworom Onwem Juda ukwu ikwe ya dika uta, uta ahu ka M’mejuworo n’Efraim dika àkú; M’gākpọte kwa umu-gi, Zaion, imegide umu-gi, Jevan, M’gēme kwa gi ka i di ka mma-agha dike.

14 Ọ bu kwa Jehova ka agāhu n’elu ha, àkú-Ya gāpu kwa dika àmùmà: Onye-nwe-ayi Jehova gāfù kwa opì-ike, je ije n’oké ifufe di iche iche nke Ndida.

15 Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēb͕ochi ha; ha gēripia kwa, zọda nkume èbè nile; ha gāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, me nkpọtu dika site na manya-vine: ha gējuputa kwa dika ọkwa-nwusa, dika nkuku nile nke ebe-ichu-àjà.

16 Jehova, bú Chineke-ha, gāzọputa kwa ha n’ubọchi ahu dika ìgwè ewu na aturu ahu, bú ndi-Ya: N’ihi na nkume di oké ọnu-ahia nke okpu-eze ka ha gābu, ndi eweliworo elu dika ọkọlọtọ n’elu ala-Ya.

17 N’ihi na le ka idi-nma-Ya si di uku! le kwa ka ima-nma-Ya si di uku! ọka gemeka umu-okorọbia tozue okè nke-ọma, manya-vine ọhu kwa umu-ab͕ọghọ nke nāmaghi nwoke.

Categories
ZEKARAIA

ZEKARAIA 10

1 Riọnu Jehova miri-ozuzo n’oge miri-ozuzo nke-ikpe-azu, ọbuná Jehova Nke nēme àmùmà; ọ bu kwa oké miri-ozuzo ka Ọ gēnye ha, nye onye ọ bula ihe-ọkukù n’ubi-ya.

2 N’ihi na teraphim ekwuwo ajọ ihe, ndi nāju ase ahuwo ọhù ugha; ọ bu kwa nrọ ugha ka ha nēzi, n’efu ka ha nākasi madu obi: n’ihi nka ka ha buliworo ije dika ìgwè ewu na aturu, anēweda ha n’ala, n’ihi na ọ dighi onye-ọzùzù-aturu ha nwere.

3 N’aru ndi-ọzùzù-aturu ka iwem di ọku, ọ bu kwa nkpi nile ka M’gēji nmehie-ha leta: n’ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha eletawo ìgwè ewu na aturu-Ya, bú ulo Juda, Ọ gēme kwa ha ka ha di ka inyinya-Ya di ebube n’agha.

4 N’aka-Ya ka nkume nkuku gēsi puta, n’aka-Ya ka ǹtú gēsi puta, n’aka-Ya ka uta agha gēsi puta, n’aka-Ya ka onye ọ bula nāchi n’ihe-ike gēsi puta n’otù.

5 Ha gādi kwa ka ndi-dike, nāzọda ndi-iro-ha n’apiti èzí nile n’agha; ha gēbu kwa agha, n’ihi na Jehova nọyere ha: ihere gēme kwa ndi nānọkwasi inyinya.

6 M’gēme kwa ka ulo Juda di ike, M’gāzọputa kwa ulo Josef, me ka ha lata, n’ihi na enwerem obi-ebere n’aru ha: ha gādi kwa ka agāsi na achupughm ha-ri: n’ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-ha, M’gāza kwa ha.

7 Ndi Efraim gādi kwa ka dike, obi-ha gāṅuri kwa ọṅu dika site na manya-vine: e, umu-ha gāhu ya, we ṅuria; obi-ha gēteghari egwú ọṅù nime Jehova.

8 M’gākpọkọta kwa ha òkù, chikọta ha; n’ihi na ab͕aputawom ha: ha gāba kwa uba otú ha baworo uba.

9 M’gāgha kwa ha dika nkpuru n’etiti ndi nile di iche iche; ọ bu kwa n’ebe nile di anya ka ha gēchetam: ha gādi kwa ndu, ha na umu-ha, we lata.

10 M’gēme kwa ka ha si n’ala Ijipt lata, ọ bu kwa n’Asiria ka M’gāchikọputa ha; ọ bu kwa ala Gilead na Lebanon ka M’gēme ka ha bata; agaghi-ahu-kwa-ra ha ọnọdu.

11 Ọ gāgabiga kwa n’oké osimiri nke nkpab͕u, tie oké osimiri nke ọtutu nmali-miri, ebe di omimi nile nke Nail gātakọrọ kwa: agēbuda kwa npako Asiria n’ala, nkpa-n’aka Ijipt gēwezuga kwa onwe-ya.

12 M’gēme kwa ka ha di ike nime Jehova; ọ bu kwa n’aha-Ya ka ha ganējeghari; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.