Categories
TAITỌS

TAITỌS 1

1 Pọl, orù nke Chineke, na onye-ozi nke Jisus Kraist, dika okwukwe ndi Chineke rọputara si di, ya na nmazu nke ezi-okwu ahu nke di n’uzọ nsọpuru-Chineke,

2 n’olile-anya nke ndu ebighi-ebi, nke Chineke, Onye nāpughi ikwu okwu-ugha, kwere nkwa ya tutu mb͕e ebighi-ebi erue;

3 ma O mere ka okwu-Ya puta ìhè n’oge nke aka Ya nime nkwusa, nke enyere n’aka mu onwem na ntukwasi-obi idebe dika ihe nke Onye-nzọputa-ayi Chineke nyere n’iwu si di;

4 Pọl nka nēdegara Taitọs akwukwọ, bú ezi nwa nkem dika okwukwe ayi kwekọrọ si di: Amara na udo diri gi nke si n’aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nzọputa-ayi puta.

5 N’ihi nka ka m’rapuru gi na Krit, ka i we dozie ihe fọduru, do kwa madu ndi-okenye n’obodo nile ọ bula, dika mu onwem nyere gi iwu;

6 ọ buru na onye ọ bula bu onye anāpughi ibo ebubo, di nke otù nwunye, nēnwe umu kwere ekwe, bú ndi anēboghi ebubo na ha nādi ndu ila-n’iyì, ndi nābughi kwa ndi nēkweghi inọ n’okpuru iwu.

7 N’ihi na onye ahu nke nēlekọta nzukọ Kraist anya aghaghi ibu onye anāpughi ibo ebubo, dika onye nāchi èzí-na-ulo Chineke; onye nābughi onye nwere isi-ike, nābughi onye nēwe iwe ọsọsọ, nābughi onye nēse okwu site n’iṅubiga manya ókè, nābughi onye nēti madu aka, nābughi onye akpiri urù nēweta ihere nākpọ nku;

8 kama ọ ghaghi ibu onye nēle ndi-ọbìa nke-ọma, onye nāhu ezi ihe n’anya, onye uche-ya zuru okè, onye ezi omume, onye di ọcha n’obi, onye nējidesi onwe-ya ike;

9 nējide okwu ahu nke kwesiri ntukwasi-obi nke di ka ozizí-ayi si di, ka o we pu idusi ọdu ike nime ozizí nke nēnye ezi ndu, na itu kwa ndi nēkwugide ekwugide nmehie-ha n’anya.

10 N’ihi na ọtutu madu di ndi nēkweghi idi n’okpuru iwu, ndi nēkwu okwu efu, ndi nāghọb͕u kwa obi madu, ma nke kachasinu ndi si n’etiti ndi obibì-úgwù puta,

11 ndi anāghaghi imechi ọnu-ha; ha bu madu ndi nēkpù madu dum di n’èzí-na-ulo iru, nēzí ihe nke nēkwesighi ka ha zí, n’ihi urù nēweta ihere.

12 Otù onye n’etiti ha, bú onye-amuma nke aka ha, siri, Ndi Krit bu ndi-ugha mb͕e dum, anu-ọhia jọrọ njọ, ndi afọ-nri nādighi-alu ọlu.

13 Àmà nka bu ezi-okwu. N’ihi ihe a were kwa aka ike tu ha nmehie-ha n’anya, ka ha we nwe ezi ndu nime okwukwe-ayi,

14 ka ha ghara iṅa nti akukọ-irò ihe di iche nke ndi-Ju, na ihe di iche iche nke madu nyere n’iwu, bú ndi nēchighari rapu ezi-okwu ahu.

15 Ihe nile di ọcha n’ebe ndi di ọcha nọ: ma n’ebe ndi emeruworo ndi nēkweghi kwa ekwe nọ ọ dighi ihe ọ bula di ọcha; kama, emeruwo ma uche-ha ma akọ-na-uche-ha.

16 Ha nēkwuputa na ha matara Chineke; ma ọlu nile ha ka ha ji gọnari Ya, ebe ha bu ihe-ùrú, ndi nādighi-ekwenye kwa, buru kwa ndi ajuru aju n’ebe ezi ọlu nile ọ bula di.

Categories
TAITỌS

TAITỌS 2

1 Ma gi onwe-gi, nēkwu ihe nile kwesiri ozizí ahu nke nēnye ezi ndu:

2 si ka agadi-ndikom nwe anya-udo, kwesiri nsọpuru, nwe uche zuru okè, nwe ezi ndu nime okwukwe-ayi, nime ihu-n’anya, nime ntachi-obi:

3 otú ahu ka agadi-ndinyom di nsọ n’omume-ha, ghara ibu ndi nēbo ebubo ugha, ghara kwa ibu orù nke iṅubiga manya ókè, ka ha buru ndi nēzí ihe ọma;

4 ka ha we me ka ndi bu umu-ab͕ọghọ nwe uche zuru okè ibu ndi nāhu di-ha n’anya, ndi nāhu umu-ha n’anya,

5 ndi uche-ha zuru okè, ndi di ọcha, ndi nālu ọlu n’ulo, ezi madu, ndi nēdo onwe-ha n’okpuru di nke aka ha, ka ewe ghara ikwulu okwu Chineke:

6 otú ahu nāriọ umu-okorọbia ka ha nwe uche zuru okè:

7 n’ihe nile nēme onwe-gi ihe-atù nke ọlu ọma; nime ozizí-gi nēgosi emebighi-emebi, ikwesi-nsọpuru,

8 okwu nke nēnye ezi ndu, nke anāpughi ima ikpe; ka ewe me onye nọ n’akuku ndi nēmegide emegide ihe-ihere n’iru, ebe ọ nēnweghi ihe nādighi nma ikwu bayere ayi.

9 Nāriọ ndi-orù ka ha nēdo onwe-ha n’okpuru ndi-nwe-ha, ka ha buru ndi nēme ihe gātọ ha ezi utọ n’ihe nile; ghara ikwu okwu imegide ha;

10 ghara itutu aka, kama ka ha nēgosi ezib͕o ikwesi-ntukwasi-obi nile; ka ha we chọ ozizí nke Onye-nzọputa-ayi Chineke nma n’ihe nile.

11 N’ihi na egosiri amara nke Chineke, nēwetara madu nile nzọputa,

12 nādọ ayi aka na nti ka ayi we ju asọpurughi-Chineke na agu ihe ọjọ di n’uwa, we di ndu uche zuru okè na nke ezi omume na nke isọpuru-Chineke n’oge di ub͕u a;

13 nēche olile-anya ahu di ngọzi na ngosi nke ebube nke Chineke uku ahu, Nke bu kwa Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist;

14 Onye nyere Onwe-ya n’ihi ayi, ka O we b͕aputa ayi n’imebi-iwu nile, sachakwara Onwe-ya otù ndi nke gābu ndi nke aka Ya, ndi obi-ha nānuru ọlu ọma ọku.

15 Nēkwu ihe ndia, were kwa ha nādusi ọdu ike, were kwa ha nātu madu nmehie-ha n’anya, n’inye iwu nile. Ka madu ọ bula ghara ilelì gi anya.

Categories
TAITỌS

TAITỌS 3

1 Nēchetara ha ka ha nēdo onwe-ha n’okpuru ndi-isi, n’okpuru ndi nwere ike, ka ha nēkwenye ekweye, ka ha buru ndi edoziworo ilu ezi ọlu nile ọ bula,

2 ka ha ghara ikwulu onye ọ bula, ghara ibu ndi nālu ọ̀gù, ka ha nwe obi-ọma, nēgosi idi-nwayọ nile n’ebe madu nile nọ.

3 N’ihi na ayi onwe-ayi buru kwa ndi nēnweghi uche n’oge gara aga, ndi nēkweyeghi, ndi anēduhie, ndi bu orù agu ihe ọjọ na ihe-utọ di iche iche, nēbi n’obi ọjọ na ekworo, ndi-ùrú, nākpọrita ibe-ayi asì.

4 Ma mb͕e egosiri obi-ọma nke Onye-nzọputa-ayi Chineke, ya na ihu-n’anya-Ya n’ebe madu nọ,

5 O siteghi n’ọlu di iche iche aluru n’ezi omume, nke ayi onwe-ayi luru, zọputa ayi, kama dika ebere-Ya si di, site n’ọsisa nke imu-ọzọ na nke ime ọhu nke Mọ Nsọ nēme,

6 Onye Ọ wusara ayi nime àkù-Ya nile, site n’aka Jisus Kraist Onye-nzọputa-ayi;

7 ka, ebe ewere amara-Ya gua ayi na ndi ezi omume, ka ayi we ghọ ndi-nketa dika olile-anya nke ndu ebighi-ebi si di.

8 Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, anamezube kwa ka i kwusie okwu bayere ihe ndia ike, ka ndi kweworo okwu Chineke we tukwasi uche n’ibu ndi-isi n’ọlu ọma. Ihe ndia di nma buru kwa ihe bara madu urù:

9 ma nēze ajuju nzuzu nile, na osuso-ọmumu nile, na esem-okwu nile, na ilu-ọ̀gù nile bayere iwu; n’ihi na ha bu ihe nābaghi urù na ihe-efu.

10 Ju madu nke nārọ òtù, mb͕e i dusiri ya ọdu nke-mbu na nke-abua;

11 ebe i matara na atughariwo obi madu di otú a, ọ nēmehie kwa, ebe ọ bu onye mara onwe-ya ikpé.

12 Mb͕e ọ bula m’gēzitere gi Atemas, ma-ọbu Tikikọs, were inu-ọku-n’obi biakutem rue Naikọpọlis: n’ihi na n’ebe ahu ka m’zubeworo inọgide na mb͕e oyi.

13 Were inu-ọku-n’obi dupu Zinas onye-iwu na Apọlos n’ije-ha, ka ihe ọ bula ghara ifọdu nke ha nēnweghi.

14 Ka ndi-ayi muta kwa ibu ndi-isi n’ọlu ọma ib͕o nkpà nākpa umu-nna-ayi, ka ha ghara ibu ndi nāmighi nkpuru.

15 Ndi nile mu na ha nọ nēkele gi. Kele ndi huru ayi n’anya n’okwukwe.

Ka amara dinyere unu nile.