Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 31

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Le, akpọwom Bezalel n’aha, bú nwa Uri, nwa Hua, nke ebo Juda:

3 emejuwokwam ya na Mọ nke Chineke, n’amam-ihe, na nime nghọta, na n’ihe-ọmuma, na n’ije-ozi ọ bula,

4 icheputa ọlu onye-ọ̀kà di iche iche, ilu ọlu n’ọla-edo, na n’ọla-ọcha, na n’ọla,

5 na n’ilu ọlu onye-ọ̀kà na idukọta ya adukọta, na n’ilu ọlu onye-ọ̀kà n’osisi, ilu ọlu n’ije-ozi ọ bula.

6 Ma Mu onwem, le, enyewom Ọhọliab tiyere ya, bú nwa Ahisamak, nke ebo Dan; ọ bu kwa n’obi onye ọ bula nke nwere obi amam-ihe ka M’tiyeworo amam-ihe, ka ha we me ihe nile nke M’nyeworo gi n’iwu:

7 ulo-ikwū nzute, na ib͕e nke diri ihe-àmà ahu, na ebe-nkpuchi-nmehie nke di n’elu ya, na ihe nile nke Ulo-ikwū ahu;

8 na table ahu na ihe-ya nile, na ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo anāgwaghi agwa na ihe-ya nile, na ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ,

9 na ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu na ukwu-ala-ya:

10 na uwe nile akpara nke ọma, na uwe nsọ nile Eron, bú onye-nchu-aja, nwere, na uwe nile nke umu-ya ndikom, ibu ndi-nchu-àjà;

11 na manu nke otite-manu, na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, bú nke diri ebe nsọ ahu: dika ihe M’nyeworo gi n’iwu si di, otú a ka ha gēme.

12 Jehova we gwa Moses okwu, si,

13 Gi onwe-gi kwa, gwa umu Israel okwu, si, N’ezie ubọchi-izu-ikem nile ka unu gēdebe: n’ihi na ihe-iriba-ama ka ọ bu n’etiti Mu na unu rue ọb͕ọ-unu nile; ka unu we mara na Mu onwem bu Jehova Nke nēdo unu nsọ.

14 Unu gēdebe kwa ubọchi-izu-ikem; n’ihi na nsọ ka ọ diri unu: onye nēme ya ka ọ ghara idi nsọ, aghaghi ime ka ọ nwua: n’ihi na onye ọ bula nke nēje ozi nime ya, agēbipu onye ahu n’etiti umu-nna-ya.

15 Ubọchi isi ka agēje ozi; ma n’ubọchi nke-asa ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike di, ọ bu ihe nsọ Jehova nwere: onye ọ bula nke nēje ozi n’ubọchi-izu-ike, aghaghi ime ka ọ nwua.

16 Ma umu Israel gēdebe ubọchi-izu-ike, ime ememe ubọchi-izu-ike ahu rue ọb͕ọ-ha nile, ọ bu ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi.

17 Ihe-iriba-ama ka ọ bu n’etiti Mu na umu Israel rue mb͕e ebighi-ebi: n’ihi na n’ubọchi isi ka Jehova mere elu-igwe na uwa, ma ọ bu n’ubọchi nke-asa ka Ọ kwusiri n’ọlu-Ya, wee zuru ike.

18 Mb͕e Ọ kpayesiri Moses uka n’ugwu Sainai, O we nye ya mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu, bú mbadamba nkume, nke ewere nkpisi-aka Chineke de ihe n’elu ha.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 32

1 Ndi Israel we hu na Moses nọrọ ọdù isi n’ugwu ahu ridata, ndi ahu we kpọkọta onwe-ha n’ebe Eron nọ, si ya, Bilie, mere ayi chi, ndi ganēje n’iru ayi; n’ihi na Moses a, bú nwoke nke mere ka ayi si n’ala Ijipt rigoputa, ayi amaghi ihe meworo ya.

2 Eron we si ha, Tijipunu nb͕a-aka ọla-edo nke di nime nti nke nwunye-unu, na nke umu-unu ndikom, na nke umu-unu ndinyom, chitaram ha.

3 Ndi ahu nile we tijipu nb͕a-aka ọla-edo nke di nime nti-ha, chitara ha Eron.

4 Ọ we nara ya n’aka-ha, were ihe eji eb͕u eb͕ub͕u b͕ue ya, me ya ka ọ ghọ nwa-ehi akpuru akpu: ha we si, Ndia bu chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n’ala Ijipt rigoputa.

5 Eron we hu ya, we wue ebe-ichu-àjà n’iru ya; Eron we kpọ òkù, si, Ememe ka agēmere Jehova echi.

6 Ha we bilie n’isi-ututu n’echi-ya, sure àjà-nsure-ọku, chita kwa ihe àjà-udo; ndi ahu we nọdu ala iri ihe na iṅu ihe, ha we bilie igwu egwú.

7 Jehova we gwa Moses okwu, si, Je, rida; n’ihi na ndi-gi, nke i mere ka ha si n’ala Ijipt rigoputa, ebibiwo onwe-ha:

8 ha esiwo n’uzọ nke M’nyere ha n’iwu wezuga onwe-ha ngwa ngwa: ha eme-woro onwe-ha nwa-ehi akpuru akpu, ha we kpọ isi ala nye ya, chu-kwa-ra ya àjà, si, Ndia bu chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n’ala Ijipt rigoputa.

9 Jehova si-kwa-ra Moses, Ahuwom ndi nka, ma, le, ndi kwesiri olu ike ka ọ bu:

10 ma ub͕u a kwe ka M’nọduru Onwem, ka iwem we di ọku megide ha, ka M’we me kwa ka ha gwusia; M’gēme kwa gi ka i buru mba uku.

11 Moses we chọ ime ka iwe Jehova, bú Chineke-ya, dajua, ọ si, Jehova, n’ìhi gini ka iwe-Gi di ọku megide ndi-Gi, nke I meworo ka ha si n’ala Ijipt puta n’ike uku na n’aka di ike?

12 N’ìhi gini ka ndi Ijipt ganēkwu, si, Ọ bu ime ha ihe ọjọ ka O mere ka ha pua, ib͕u ha n’ugwu, na ime ka ha si n’elu uwa gwusia? Si n’idi-ọku nke iwe-Gi chigharia, chegharia n’ihe ọjọ a I nēchè imegide ndi-Gi.

13 Cheta Abraham, na Aisak, na Israel, bú ndi-orù-Gi, ndi I ji Onwe-gi ṅuru iyi, I we gwa ha okwu, si, M’gēme ka nkpuru-unu ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, ala nka nile kwa nke M’kwuworo okwu bayere ya, M’gēnye nkpuru-gi ya, ha gēketa kwa ya rue mb͕e ebighi-ebi.

14 Jehova we chegharia uche bayere ihe ọjọ nke O kwuru, si na Ọ gēme ndi-Ya.

15 Moses we chigharia, si n’ugwu ahu rida, mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu di kwa n’aka-ya; bú mbadamba nkume nke edere ihe n’iru ha abua; n’otù iru na n’iru nke-ọzọ ka edeworo ihe n’elu nkume ahu.

16 Mbadamba nkume ahu, ọlu Chineke ka ha bu; odide ahu kwa, odide Chineke ka ọ bu, bú eb͕ub͕u eb͕uru n’elu mbadamba nkume abua ahu.

17 Joshua we nu olu ndi Israel ka ha nēti nkpu, ọ we si Moses, Olu agha di n’ọmuma-ulo-ikwū.

18 Ọ si, Ọ bughi olu ndi nāza n’idi-ike, ọ bughi kwa olu ndi nāza n’adighi-ike; olu ndi nāza n’ibù abù ka mu onwem nānu.

19 O rue, mb͕e ọ biaruru ọmuma-ulo-ikwū ahu nso, na ọ huru nwa-ehi ahú na otite-egwú ahu: iwe Moses we di ọku, o we tupu mbadamba nkume ahu n’aka-ya, tupia ha n’okpuru ugwu ahu.

20 O we were nwa-ehi ahu nke ha mere, sure ya n’ọku, gwe ya rue mb͕e o mere irighiri, o we fesa ya n’elu miri, me ka umu Israel ṅua ya.

21 Moses we si Eron, Gini ka ndi nka mere gi, na i mewo ka nmehie uku biakwasi ha?

22 Eron we si, Ka iwe onye-nwem ghara idi ọku: gi onwe-gi amawo ndi nka, na ọ bu nime ihe ọjọ ka ha nọ.

23 Ha we sim, Mere ayi chi, ndi ganēje n’iru ayi: n’ihi na Moses a, bú nwoke nke mere ka ayi si n’ala Ijipt rigoputa, ayi amaghi ihe meworo ya.

24 M’we si ha, Onye ọ bula nke nwere ọla-edo, ka ha tijipu ya n’aru ha; ha we nyem: m’we tubà ya n’ọku, nwa-ehi a we puta.

25 Moses we hu ndi ahu na ndi nādighi nchikọta ka ha bu; n’ihi na Eron emewo ka ha ghara idi nchikọta, ka ha buru ihe-ntakwu n’etiti ndi nēbili imegide ha:

26 Moses we guzo n’ọnu-uzọ-ama nke ọmuma-ulo-ikwū ahu, si, Ònye diri Jehova? ya biakutem. Umu-ndikom Livai nile we chikọta onwe-ha n’ebe ọ nọ.

27 Ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Turunu, Nwoke ọ bula n’etiti unu, ya turu mma-agha-ya n’apata-ukwu-ya, gabiganu bia-ghachi kwa site n’otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ n’ọmuma-ulo-ikwū a nile, b͕u-kwa-nu, nwoke ọ bula, ya b͕ue nwa-nne-ya, nwoke ọ bula, ya b͕ue eyì-ya, nwoke ọ bula, ya b͕ue onye-aru-ya.

28 Umu-ndikom Livai we me dika okwu Moses si di: ihe ra ka nnù ndikom asa na ọgu iri we si n’etiti ndi Israel da n’ubọchi ahu.

29 Moses we si, Mejuenu aka-unu ta nye Jehova, n’ihi na nwoke ọ bula nēmegide nwa-ya nwoke, nēmegide kwa nwa-nne-ya nwoke; ka Ọ we nye unu ngọzi ta.

30 O rue, n’echi-ya, na Moses siri ndi Israel, Unu onwe-unu emehiewo nmehie uku: ma ub͕u a m’gārigokuru Jehova; eleghi anya m’gēkpuchi nmehie-unu.

31 Moses we jeghachikuru Jehova, si, Biko, ndi nka emehiewo nmehie uku, mere onwe-ha chi ọla-edo.

32 Ma ub͕u a, ọ buru na I gāb͕aghara nmehie-ha; ma ọ buru na I meghi ya, biko, hichapum n’akwukwọ-Gi nke I deworo.

33 Jehova we si Moses, Onye ọ bula nke mehieworo megidem, ya ka M’gēhi-chapu n’akwukwọm.

34 Ma ub͕u a, je, duru ndim rue ebe ahu nke M’gwaworo gi okwu bayere ya: le, mọ-ozim ganēje n’iru gi: ma n’ubọchi mb͕e M’nēleta, M’gēwere kwa nmehie-ha leta ha.

35 Jehova we tie ndi Israel ihe, n’ihi na ha mere nwa-ehi ahu, nke Eron mere.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 33

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, Je, si n’ebe a rigo, gi onwe-gi na ndi ahu nke i mere ka ha si n’ala Ijipt rigoputa, rue ala ahu nke M’ṅuru Abraham iyi, ṅu-kwa-ra Aisak, ṅu-kwa-ra Jekob, si, Nkpuru-gi ka M’gēnye ya:

2 M’gēziga kwa mọ-ozi n’iru gi; M’gāchupu kwa ndi Kenean, na ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus:

3 rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya: n’ihi na M’gaghi-arigo n’etiti gi; n’ihi na ndi kwesiri olu ike ka i bu: ka M’we ghara ime ka i gwusia n’uzọ.

4 Ndi Israel we nu okwu ọjọ a, ha we rue újú: ọ dighi kwa onye ọ bula tiyere ihe-ichọ-nma-ya n’aru ya.

5 Jehova we si Moses, Si umu Israel, Unu onwe-unu bu ndi kwesiri olu ike: asi na ọ bu otù ntabi-anya ka M’gārigo n’etiti gi, M’gēme kwa ka i gwusia; ma ub͕u a wepu ihe-ichọ-nma-gi nile n’aru gi tọb͕ọ, M’we mara ihe M’gēme gi.

6 Umu Israel we napusi onwe-ha ihe-ichọ-nma-ha nile site n’ugwu Horeb gaba.

7 Ma Moses nēwere ulo-ikwū ahu, nāmara onwe-ya n’azu ọmuma-ulo-ikwū, n’ebe di anya site n’ọmuma-ulo-ikwū ahu; ọ we kpọ ya, Ulo-ikwū nzute. O rue, na onye ọ bula nke nāchọ Jehova nāpu je ulo-ikwū nzute ahu nke di n’azu ọmuma-ulo-ikwū.

8 O rue, mb͕e Moses puru ije Ulo-ikwū ahu, na ndi Israel nile biliri, guzo onwe-ha ọtọ, nwoke ọ bula n’ọnu-uzọ nke ulo-ikwū-ya, nēlegide Moses anya n’azu, rue mb͕e ọ bara n’Ulo-ikwū ahu.

9 O rue, mb͕e Moses batara n’Ulo-ikwū ahu, na ogidi igwe-oji ahu ridatara, guzo n’ọnu-uzọ nke Ulo-ikwū: Jehova we gwa Moses okwu.

10 Ndi Israel nile we hu ogidi igwe-oji ka o nēguzo n’ọnu-uzọ nke Ulo-ikwū ahu: ndi ahu nile we bilie, kpọ isi ala, nwoke ọ bula n’ọnu-uzọ nke ulo-ikwū-ya.

11 Jehova we gwa Moses okwu iru n’iru, dika madu nāgwa eyì-ya okwu. Ọ we laghachi n’ọmuma-ulo-ikwū ahu: ma onye nējere ya ozi, bú Joshua, nwa Nun, bú okorọbia, adighi-esi n’etiti Ulo-ikwū ahu pua.

12 Moses we si Jehova, Le, Gi onwe-gi nāsim, Me ka ndi nka rigota: ma Gi onwe-gi emeghi ka M’mara onye I gēziga ka mu na ya yikọ je. Ma Gi onwe-gi asiwo, Amawom i n’aha, ọzọ kwa, i hutawo amara n’irum.

13 Ma ub͕u a, biko, ọ buru na ahutawom amara n’iru Gi, biko, mem ka m’mara uzọ-Gi nile, m’gāmara kwa Gi, ka m’we huta amara n’iru Gi: Gi le kwa na ndi-Gi ka mba nka bu.

14 Ọ si, Irum ganēje, M’gēme kwa ka i zuru ike.

15 Ọ si Ya, Ọ buru na iru-Gi adighi-eje, emela ka ayi si n’ebe a rigo.

16 N’ihi na ọ̀ bu n’ihi gini ka agāmara ub͕u a na ahutawom amara n’iru Gi, mu onwem na ndi-Gi? ọ̀ bughi n’ojije I nēsoro ayi je, ewe kewapu ayi, bú mu onwem na ndi-Gi, n’ebe ndi nile nọ ndi bi n’elu uwa.

17 Jehova we si Moses, Ihe a nke i kwuworo, M’gēme kwa ya: n’ihi na i hutawo amara n’irum, amawokwam i n’aha.

18 Ọ si, Biko, me ka m’hu ebube-Gi.

19 Ọ si, Mu onwem gēme ka idi-nmam nile gabiga n’iru gi, M’gākpọ kwa òkù bayere aha Jehova n’iru gi: M’gēme-kwa-ra onye ahu amara, bú onye M’gēmere amara, M’gēnwe kwa obi-ebere n’aru onye ahu nke M’gēnwe obi-ebere n’aru ya.

20 Ọ si kwa, I pughi ihu irum anya: n’ihi na madu agaghi-ahum anya, di kwa ndu.

21 Jehova we si, Le, ọnọdu di n’akukum, i gēguzo kwa onwe-gi ọtọ n’elu oké nkume ahu.

22 O gēru kwa, mb͕e ebubem nāgabiga, na M’gētiye gi nime oghere nke oké nkume ahu, b͕asa ọbu-akam b͕ochita gi, rue mb͕e M’gabiga-woro:

23 M’gēwezuga kwa ọbu-akam, i gāhu kwa azum anya: ma agaghi-ahu irum anya.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 34

1 Jehova we si Moses, Wara onwe-gi mbadamba nkume abua dika nke-mbu: M’gēdekwasi kwa na mbadamba nkume ahu okwu nile nke di n’elu mbadamba nkume mbu, nke i tupiara.

2 Nọ na njikere rue ututu, rigota n’ugwu Sainai n’ututu, guzorom onwe-gi ọtọ n’ebe ahu n’elu ugwu ahu.

3 Ọ dighi kwa onye ọ bula gēsoro gi rigota, ọzọ kwa, ka aghara ihu onye ọ bula n’ugwu ahu nile; ọzọ, ìgwè ewu na aturu ma -ọbu ìgwè ehi atala nri n’akuku ugwu ahu.

4 Ọ we wa mbadamba nkume abua dika nke-mbu; Moses we bilie n’isi-ututu, rigorue ugwu Sainai, dika Jehova nyere ya iwu, o were kwa mbadamba nkume abua n’aka-ya.

5 Jehova we ridata n’igwe-oji, o guzo onwe-ya n’ebe Ọ nọ n’ebe ahu, we kpọkue aha Jehova.

6 Jehova we gabiga n’iru ya, kpọ òkù, si, Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi-ebere, Onye nēme amara, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Onye nāba uba n’ebere na ezi-okwu;

7 Onye nēdebere nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri ọtutu ub͕ò ebere, Onye nāb͕aghara ajọ omume na njehie na nmehie: ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmaghi; Ọ nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta kwa umu umu, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ.

8 Moses we me ngwa, rube isi-ya n’ala, kpọ isi ala.

9 Ọ si, Biko, ọ buru na ahutawom amara n’iru Gi, Onye-nwe-ayi, biko, ka Onye-nwe-ayi nēje n’etiti ayi; n’ihi na ndi kwesiri olu ike ka ayi bu; Gi b͕aghara kwa ajọ omume-ayi na nmehie-ayi, keta kwa ayi n’ihe-nketa.

10 Ọ we si, Le, Mu onwem nāb͕a ndu: n’iru ndi-gi nile ka M’gālu oké ọlu di iche iche, bú nke ọ dighi mb͕e ekere ha n’uwa nile, ma-ọbu nime mba ọ bula: ndi nile ndi gi onwe-gi nọ n’etiti ha gāhu kwa ọlu Jehova, n’ihi na ihe-egwù ka ọ bu, bú nke Mu onwem nēme n’ebe i nọ.

11 Debere onwe-gi ihe nke Mu onwem nēnye gi n’iwu ta: le, M’gaje ichupu ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, n’iru gi.

12 Lezie onwe-gi anya, ka gi na ndi bi n’ala nke gi onwe-gi nābà nime ya ghara ib͕a ndu, ka ọ we ghara ibu ọnyà n’etiti gi:

13 kama unu gākwatu ebe-ichu-àjà nile ha, tupia ogidi nile ha, b͕utu Asherim-ha:

14 n’ihi na i gaghi-akpọ isi ala nye chi ọzọ: n’ihi na Jehova, Nke Onye-ekworo bu aha-Ya, Chineke ekworo ka Ọ bu:

15 ka gi na ndi bi n’ala ahu we ghara ib͕a ndu, ha we so chi-ha nākwa iko, churu chi-ha àjà, otù onye ewe kpọ gi, i we rie ufọdu nime ihe àjà-ya;

16 i we lutara umu-gi ndikom ufọdu nime umu-ha ndinyom, umu-ha ndinyom we so chi-ha nākwa iko, me kwa ka umu-gi ndikom soro chi-ha nākwa iko.

17 Gi emerela onwe-gi chi akpuru akpu.

18 Ememe achicha ekoghi-eko ka i gēdebe. Ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko, dika M’nyere gi iwu, na mb͕e akara àkà n’ọnwa Ebib: n’ihi na ọ bu nime ọnwa Ebib ka i siri n’Ijipt puta.

19 Nwa ọ bula nke meghere àkpà-nwa bu nkem; na anu-ulo-gi ọ bula nke bu oké, nwa nke meghere àkpà-nwa ehi ma-ọbu aturu.

20 Ma nwa inyinya-ibu nke meghere àkpà-nwa, i gēwere nwa-aturu b͕aputa ya: ma ọ buru na i b͕aputaghi ya, i gāb͕aji kwa olu-ya. Ọkpara ọ bula n’etiti umu-gi ka i gāb͕aputa. Ma ọ dighi onye agāhu n’irum ka ọ b͕a aka.

21 Ubọchi isi ka i gālu ọlu-gi, ma n’ubọchi nke-asa i gākwusi: n’ilu-ọlu-ubi na n’owuwe-ihe-ubi i gākwusi.

22 I gēme-kwa-ra onwe-gi ememe nke izù asa nke ubọchi asa, bú nke nkpuru mbu nke obìbì ọka wheat, na ememe nke nchikọta-ihe n’ọb͕ub͕a arọ.

23 Ub͕ò atọ n’arọ ka agāhu ndikom-i nile n’iru Onye-nwe-unu Jehova, bú Chineke nke Israel.

24 N’ihi na M’gānara mba di iche iche ala-ha n’iru gi, me ka ókè-ala-gi nile sa mbara: ọ dighi kwa onye ọ bula gēnwe anya-uku n’ebe ala-gi di, mb͕e i nārigo ka ewe hu gi n’iru Jehova, bú Chineke-gi, ub͕ò atọ n’arọ.

25 Eb͕upula ọbara nke àjàm n’elu ihe nēko achicha; àjà ememe ngabiga agaghi-adigide kwa abali nile rue ututu.

26 Ihe mbu nke nkpuru mbu nke ala-ubi-gi ka i gēwebata n’ulo nke Jehova, bú Chineke-gi. Esila nwa-ewu nime miri-ara nke nne-ya.

27 Jehova we si Moses, Dere onwe-gi okwu ndia n’ihe: n’ihi na dika okwu ndia si di ka M’b͕aworo ndu n’etiti Mu na gi, na n’etiti Mu na umu Israel.

28 Ọ we nọ n’ebe ahu, ya na Jehova, ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri o riri, ọ dighi kwa miri ọ ṅuru. Ọ we de n’elu mbadamba nkume abua ahu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú okwu iri ahu.

29 O rue, mb͕e Moses siri n’ugwu Sainai rida (mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu di kwa n’aka Moses mb͕e o siri n’ugwu ahu rida), na Moses amaghi na akpukpọ iru-ya nēnwuputa ìhè mb͕e Ọ kpayere ya uka.

30 Eron na umu Israel nile we hu Moses, ma, le, akpukpọ iru-ya nwuputara ìhè; ha we tua egwu ibiaru ya nso.

31 Moses we kpọ ha òkù; Eron na ndi-isi nile nime nzukọ ahu we laghachikute ya: Moses we gwa ha okwu.

32 Emesi kwa umu Israel nile biaruru nso, ọ we nye ha n’iwu uka nile nke Jehova kpayere ya n’ugwu Sainai.

33 Moses we gwabìe ha okwu, kpudo ihe-nkpudo n’iru-ya.

34 Ma mb͕e ọ bula Moses bara nime n’iru Jehova ikpayere Ya uka, ọ wezuga ihe-nkpudo ahu rue mb͕e ọ putara: ọ we puta, gwa umu Israel ihe nke enyere ya n’iwu;

35 umu Israel we hu iru Moses, na akpukpọ iru Moses nēnwuputa ìhè: Moses we kpughachi ihe-nkpudo ahu n’iru-ya, rue mb͕e ọ bara nime ikpayere Ya uka.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 35

1 Moses we kpọkọta nzukọ nile nke umu Israel, si ha, Ndia bu okwu nke Jehova nyeworo n’iwu, ka unu me ha.

2 Ubọchi isi ka agēje ozi, ma n’ubọchi nke-asa unu gēnwe ubọchi nsọ, bú ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike Jehova nwere: onye ọ bula nke nēje ozi nime ya, agēme ka ọ nwua.

3 Unu afunwula ọku n’ebe-obibi-unu nile n’ubọchi-izu-ike.

4 Moses we gwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, si, Nka bu ihe Jehova nyere n’iwu, si,

5 Sinu n’etiti unu wetara Jehova àjà-nbuli: onye ọ bula nke obi-ya nwere afọ-ofufo, ya weta ya, bú àjà-nbuli nke Jehova; ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla;

6 na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, na aji ewu;

7 na akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na akpukpọ seal, na osisi acacia;

8 na manu itiye n’ihe nēnye ìhè, na uda di iche iche itiye na manu nke otite-manu ahu, na ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me;

9 na nkume onyx, na nkume ihiọgide n’ihe, ihiọgide n’ephod, na ihiọgide n’ihe-ib͕ochi-obi.

10 Onye ọ bula n’etiti unu nke nwere obi amam-ihe, ha gābia kwa, me ihe nile nke Jehova nyere n’iwu;

11 ebe-obibi ahu, na ulo-ikwū-ya, na ákwà-nkpuchi-ya, na nko-ya nile, na ibo-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na ukwu-ya nile,

12 na ib͕e ahu, na nkpa-n’aka-ya abua, na ebe-nkpuchi-nmehie, na ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi;

13 na table ahu, na nkpa-n’aka-ya abua, na ihe-ya nile, na achicha iru Chineke;

14 na ihe-idọba-oriọna nke ihe nēnye ìhè, na ihe-ya nile, na oriọna-ya nile, na manu itiye n’ihe nēnye ìhè;

15 na ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na nkpa-n’aka-ya abua, na manu nke otite-manu ahu, na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na ákwà-nkwuchi ọnu-uzọ n’ọnu-uzọ nke ebe-obibi ahu;

16 na ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, na ihe-ọkpukpa ọla nke diri ya, na nkpa-n’aka-ya abua, na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu, na ukwu-ala-ya;

17 na ákwà-ngechi nile nke ogige, na ide-ya nile, na ukwu-ha, na ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ-ama nke ogige ahu:

18 na ǹtú nile nke ebe-obibi ahu; na ǹtú nile nke ogige, na udọ̀ nile ha;

19 na uwe nile akpara nke-ọma, iji je ozi n’ebe nsọ ahu, na uwe nsọ nile Eron, bú onye-nchu-àjà, nwere, na uwe umu-ya ndikom, ibu ndi-nchu-àjà.

20 Nzukọ nile nke umu Israel we si n’iru Moses pua.

21 Ha we bia, onye ọ bula nke obi-ya kwaliri ya, na onye ọ bula nke mọ-ya mere ka o nwe afọ-ofufo, ha we weta àjà-nbuli Jehova, iji je ozi ulo-ikwū nzute ahu, na iji fè òfùfè-ya nile, na iji me uwe nsọ ahu.

22 Ha we bia, ma ndikom ma ndinyom, onye ọ bula nke obi-ya nwere afọ-ofufo, ha we weta ihe-nkpọchi-uwe, na nb͕a-aka imi, na nb͕a-aka-akàrà, na ihe anēyi n’olu, ihe ọla-edo ọ bula; bú onye ọ bula nke fere àjà-ofufé ọla-edo nye Jehova.

23 Onye ọ bula nke achọtara n’aka-ya ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, na aji ewu, na akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na akpukpọ seal, chitara ha.

24 Onye ọ bula nke nēbuli àjà-nbuli nke ọla-ọcha na ọla wetara àjà-nbuli nke Jehova: nwoke ọ bula, nke achọtara osisi acacia n’aka-ya iji je ozi nke òfùfè ahu, we weta ya.

25 Nwayi ọ bula nke nwere obi amam-ihe were kwa aka-ya tu ogho, ha we weta ogho nke ha turu, bú ogho anunu ahu, na ogho ododo ahu, na ogho uhie ahu, na ezi ákwà ọcha ahu.

26 Ndinyom nile ndi obi-ha kwaliri ha n’amam-ihe tu-kwa-ra aji ewu.

27 Ndi-isi chitara nkume onyx, na nkume ihiọgide n’ihe, ihiọgide n’ephod ahu, na ihiọgide n’ihe-ib͕ochi-obi ahu;

28 na uda ahu, na manu ahu; itiye n’ihe nēnye ìhè, na ibu manu nke otite-manu ahu, na ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me.

29 Nwoke ọ bula na nwayi ọ bula, ndi obi-ha mere ka ha nwe afọ-ofufo iweta ihe iji je ozi nile, nke Jehova nyere iwu ka eme n’aka Moses, umu Israel ahu wetara onyinye afọ-ofufo nye Jehova.

30 Moses we si umu Israel, Lenu, Jehova akpọwo Bezalel n’aka, bú nwa Uri, nwa Hua, nke ebo Juda;

31 Ọ mejuwo kwa ya na Mọ nke Chineke, n’amam-ihe, na nime nghọta, na n’ihe-ọmuma, na n’ije-ozi ọ bula;

32 ya na icheputa ọlu onye-ọ̀kà di iche iche, ilu ọlu n’ọla-edo, na n’ọla-ọcha, na n’ọla,

33 na n’ilu ọlu onye-ọ̀ka na nkume ihiọgide ahiọgide, na n’ilu ọlu onye-ọ̀kà n’osisi, ilu ọlu n’ije-ozi ọ bula nke onye-ọ̀kà.

34 Ọ bu kwa izí ihe ka O tiyeworo n’obi-ya, ya onwe-ya na Ọhọliab, bú nwa Ahisamak, nke ebo Dan.

35 O me-juwo ha n’amam-ihe nke obi, ije ozi ọ bula, nke onye nātu akika, na nke onye-ọ̀kà, na nke onye-ọdudu-ákwà, bú n’ogho anunu, na n’ogho ododo, na n’ogho uhie, na n’ezi ákwà ọcha, na nke ọkpa-ákwà, bú ije ozi nke ndi nēje ozi ọ bula, na nke ndi nēcheputa ọlu onye-ọ̀kà di iche iche.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 36

1 Bezalel na Ọhọliab gālu kwa ọlu, ha na nwoke ọ bula nke nwere obi amam-ihe, ndi Jehova tiyeworo amam-ihe na nghọta nime ha ka ha mara ije ozi ọ bula nke òfùfè nke ebe nsọ ahu, dika ihe nile si di nke Jehova nyere n’iwu.

2 Moses we kpọ Bezalel na Ọhọliab, na nwoke ọ bula nwere obi amam-ihe, onye Jehova tiyere amam-ihe n’obi-ya, onye ọ bula nke obi-ya kwaliri ya ibiaru nso ozi ahu ije ya:

3 ha we si n’iru Moses were ihe àjà-nbuli ahu nile nke umu Israel wetara iji je ozi nke òfùfè nke ebe nsọ ahu, ime ya. Ma ndi Israel ahu nọ n’iwetara ya onyinye-afọ-ofufo kwa-ututu.

4 Ndi-amam-ihe ahu nile, ndi nēje ozi nile nke ebe nsọ ahu, ha nile n’otù n’otù we si n’ozi-ha nke ha nēje bia,

5 gwa Moses okwu, si, Ndi Israel nēweta ọtutu ihe kari nke gēzuru òfùfè nke diri ozi ahu nke Jehova nyere iwu ka eje ya.

6 Moses we nye iwu, ha we me ka ekwusa ya n’ọmuma-ulo-ikwū nile, si, Nwoke ma-ọbu nwayi, ka ha ghara ije ozi ọzọ bayere àjà-nbuli nke ebe nsọ ahu. Ewe me ka ndi Israel wetabìe ihe.

7 Ihe-ije-ozi ahu we zuere ha iji je ozi nile, ime ya, ihe we fọdu.

8 Onye ọ bula nke nwere obi amam-ihe n’etiti ndi nēje ozi ahu we me ebe-obibi ahu: were ákwà-nkwuba iri me ya; ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, nke emere ka ha yie cherubim, bú ọlu nke onye-ọ̀kà, ihe ndia ka o ji me ha.

9 Ogologo nke otù ákwà-nkwuba di orú cubit na asatọ, obosara nke otù ákwà-nkwuba di kwa cubit anọ: otù ọtùtù ka ákwà-nkwuba nile nwere.

10 O we jikọta ákwà-nkwuba ise, otù na ibe-ya: jikọta kwa ákwà-nkwuba ise nke-ọzọ, otù na ibe-ya.

11 O ji kwa ogho anunu me anya-nko n’elu ọnu-ọnu nke otù ákwà-nkwuba, site na nsọtu-ya nime njikọta ahu: otú a ka ọ me-kwa-ra n’ọnu-ọnu ákwà-nkwuba nke dipuru adipu nime njikọta nke-abua.

12 Ọgu anya-nko abua na iri ka o mere n’otù ákwà-nkwuba, ọgu anya-nko abua na iri ka ọ me-kwa-ra nime nsọtu nke ákwà-nkwuba nke di na njikọta nke-abua: anya-nko cheritara onwe-ha iru, otù na ibe-ya.

13 O me-kwa-ra ọgu nko ọla-edo abua na iri, were nko ahu jikọta ákwà-nkwuba, otù na ibe-ya: ebe-obibi ahu we buru otù.

14 O me-kwa-ra ákwà-nkwuba aji ewu, ibu ulo-ikwū n’elu ebe-obibi ahu: ákwà-nkwuba iri na otù ka o mere ha.

15 Ogologo nke otù ákwà-nkwuba di orú cubit na iri, cubit anọ ka obosara nke otù ákwà-nkwuba di kwa: otù ọtùtù ka ákwà-nkwuba iri na otù ahu nwere.

16 O jikọta-kwa-ra ákwà-nkwuba ise iche, na ákwà-nkwuba isi iche.

17 O me-kwa-ra ọgu anya-nko abua na iri n’elu ọnu-ọnu nke ákwà-nkwuba ahu dipuru adipu nime njikọta ahu, ọ me-kwa-ra ọgu anya-nko abua na iri n’elu ọnu-ọnu nke ákwà-nkwuba nke dipuru adipu nime njikọta nke-abua.

18 O me-kwa-ra ọgu nko ọla abua na iri, ijikọta ulo-ikwū ahu ka ọ we buru otù.

19 O were mere ulo-ikwū ahu ihe-nkpuchi akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, ya na ihe-nkpuchi akpukpọ seal n’elu ya.

20 O we mere ebe-obibi ahu ibo osisi acacia, nke nēguzo ọtọ.

21 Cubit iri ka ogologo nke otù ibo di, otù cubit na nkera cubit ka obosara nke otù ibo di kwa.

22 Otù ibo nwere ihe-nhiọye abua, nke ekwukọtara, otù na ibe-ya: otú a ka o mere nye ibo nile nke ebe-obibi ahu.

23 O we mere ebe-obibi ahu ibo ahu; orú ibo ka ọ mere nye akuku Ndida chere iru na Ndida:

24 ọgu ukwu ọla-ọcha abua ka o me-kwa-ra n’okpuru orú ibo ahu; ukwu abua n’okpuru otù ibo inara ihe-nhiọye-ya abua, ukwu abua kwa n’okpuru ibo ọzọ inara ihe-nhiọye-ya abua.

25 O we mere akuku nke-abua nke ebe-obibi ahu orú ibo, bú akuku Ugwu,

26 na ọgu ukwu ọla-ọcha ha abua; ukwu abua n’okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n’okpuru ibo ọzọ.

27 Isi ebe-obibi ahu nke chere iru n’Ọdida-anyanwu ka o me-kwa-ra ibo isi nye.

28 Ibo abua ka o me-kwa-ra nye nkuku ebe-obibi ahu n’isi-ya.

29 Ha bu ihe abua ejikọtara n’otù n’okpuru, ha abua bu kwa otù ihe zuru okè rue isi-ya rue otù nb͕a-aka ahu: otú a ka o mere nye ha abua na nkuku abua ahu.

30 Ha di kwa ibo asatọ, na ukwu ọla-ọcha ha, ukwu iri na isi; ukwu abua n’okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n’okpuru ibo ọzọ.

31 O me-kwa-ra nkpọrọ osisi acacia; ise ka o mere nye ibo otù akuku nke ebe-obibi ahu,

32 nkpọrọ ise ka o me-kwa-ra nye ibo akuku nke-ọzọ nke ebe-obibi ahu, nkpọrọ ise ka o me-kwa-ra nye ibo nke ebe-obibi ahu, bú isi-ya chere iru n’Ọdida-anyanwu.

33 O we me ka nkpọrọ etiti gabiga n’etiti ibo ahu, si n’otù nsọtu rue nsọtu ọzọ.

34 Ọ machita-kwa-ra ibo nile ọla-edo, were kwa ọla-edo me nb͕a-aka-ha, ka ha buru ọnọdu itiye nkpọrọ ahu, ọ machita-kwa-ra nkpọrọ ahu ọla-edo.

35 O we me ákwà-nb͕ochi ahu nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma: ọ bu ọlu onye-ọ̀kà, o mere ya ka o yie cherubim.

36 O we mere ya ide acacia anọ, machita ha ọla-edo: nkpọye-ha bu ọla-edo; o we wuara ha ukwu ọla-edo anọ.

37 O we mere ọnu-uzọ Ulo-ikwū ahu ákwà-nkwuchi, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ọ bu ọlu onye-ọdudu-ákwà;

38 o me-kwa-ra ide ise ya na nkpọye-ha, machita isi-ha na ngegide-ha ọla-edo: ma ukwu ise ha bu ọla.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 37

1 Bezalel me-kwa-ra ib͕e osisi acacia: cubit abua na nkera ka ogologo-ya di, otù cubit na nkera ka obosara-ya di kwa, otù cubit na nkera ka elu-ya di kwa:

2 ọ machita ya ọla-edo anāgwaghi agwa, nime na azu ka ọ machitara ya, o we mere ya mpempe ọla-edo buruburu

3 O we wuara ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, n’ukwu anọ ya; bú nb͕a-aka abua n’otù akuku-ya, na nb͕a-aka abua n’akuku-ya ọzọ.

4 O me-kwa-ra nkpa-n’aka osisi acacia, machita ha ọla-edo.

5 O we me ka nkpa-n’aka ahu ba na nb͕a-aka ahu n’elu akuku ib͕e ahu, iji ebu ib͕e ahu.

6 O me-kwa-ra ebe-nkpuchi-nmehie nke ọla-edo anāgwaghi agwa: cubit abua na nkera ka ogologo-ya di, otù cubit na nkera ka obosara-ya di.

7 O me-kwa-ra cherubim ọla-edo abua; ihe akpuru akpu ka o mere ha, na nsọtu abua nke ebe-nkpuchi-nmehie;

8 otù cherub n’otù nsọtu, na otù cherub na nsọtu nke-ọzọ: site n’ebe-nkpuchi-nmehie ka o mere cherubim ahu, na nsọtu-ya abua.

9 Cherubim ahu nāb͕asa kwa nkù-ha n’elu, nēkpuchi ebe-nkpuchi-nmehie na nkù-ha, iru-ha nēcherita kwa onwe-ha; n’ebe ebe-nkpuchi-nmehie di ka iru cherubim ahu di.

10 O me-kwa-ra table osisi acacia ahu: cubit abua ka ogologo-ya di, otù cubit ka obosara-ya di, otù cubit na nkera ka idi-elu-ya di:

11 ọ machita ya ọla-edo anāgwaghi agwa, me-kwa-ra ya mpempe ọla-edo buruburu.

12 O me-kwa-ra ya ihe-njìkọ buruburu nke ra ka otù ọbu-aka, mere ihe-njikọ-ya mpempe ọla-edo buruburu.

13 Ọ wuara ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, tukwasi nb͕a-aka ahu na nkuku anọ nke di n’ukwu anọ ya.

14 Na nso ihe-njikọ ahu ka nb͕a-aka di, ka ha buru ọnọdu itiye nkpa-n’aka eji ebu table ahu.

15 O ji kwa osisi acacia me nkpa-n’aka ahu, ọ machita ha ọla-edo, iji ebu table ahu.

16 O me-kwa-ra ihe nile nke di n’elu table, bú afere-ya nile, na ngaji-ya nile, na ọkwa-ya nile, na iko-ya nile, nke eji awusi àjà-ihe-ọṅuṅu: ọla-edo anāgwaghi agwa ka ha bu.

17 O me-kwa-ra ihe-idọba-oriọna ahu nke ọla-edo anāgwaghi agwa: ihe akpuru akpu ka o mere ihe-idọba-oriọna ahu, bú ukwu-ala-ya na alaka-ya; iko-ya nile, bú isi-ya nile, na okoko-ya nile, sitere na ya:

18 alaka isi nēsi n’akuku-ya abua waputa; alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu n’otù akuku-ya, alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu kwa n’akuku-ya nke-ọzọ:

19 iko atọ emere dika ifuru osisi almond di n’otù alaka, otù isi na otù okoko; iko atọ emere dika ifuru osisi almond di kwa n’alaka-ibe-ya, otù isi na otù okoko: otú a ka ọ diri alaka isi ahu nke nēsi n’ihe-idọba-oriọna ahu waputa.

20 iko anọ emere dika ifuru osisi almond di kwa n’ihe-idọba-oriọna ahu, isi-ha na okoko-ha:

21 otù isi di kwa n’okpuru alaka abua site na ya, otù isi di kwa n’okpuru alaka abua site na ya, otù isi di kwa n’okpuru alaka abua site na ya, diri alaka isi ahu nke nēsi nime ya waputa.

22 Isi-ha na alaka-ha sitere na ya; ihe-idọba-oriọna ahu nile bu otù ihe eji ọla-edo nke anāgwaghi agwa kpu.

23 O me-kwa-ra oriọna-ya, ha di asa, na nkpa-ya nile, na ihe-ikpakepu-ọku-ya nile, ha bu ọla-edo anāgwaghi agwa.

24 Otù talent nke ọla-edo anāgwaghi agwa ka o ji me ya, ya na ihe-ya nile.

25 O me-kwa-ra ebe-ichu-àjà ahu nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, osisi acacia ka ọ bu: otù cubit ka ogologo-ya di, otù cubit ka obosara-ya di kwa, ihe nwere akuku anọ ra nrata ka ọ bu; cubit abua ka idi-elu-ya di kwa; mpi-ya nile sitere na ya.

26 Ọ machita ya ọla-edo anāgwaghi agwa, elu-ya, na akuku-ya nile buruburu, na mpi-ya nile: o we mere ya mpempe ọla-edo buruburu.

27 Nb͕a-aka ọla-edo abua ka o me-kwa-ra nye ya n’okpuru mpempe-ya, n’elu ihe-akuku-ya abua, n’elu akuku-ya abua, ka ha buru ọnọdu inara nkpa-n’aka eji ebu ya.

28 O ji kwa osisi acacia me nkpa-n’aka ahu, ọ machita ha ọla-edo.

29 O me-kwa-ra manu otite-manu ahu di nsọ, na ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ nke anāgwaghi agwa, bú nke eji uda utọ di iche iche me, bú ọlu onye nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 38

1 O me-kwa-ra ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku ahu, ọ bu osisi acacia: cubit ise ka ogologo-ya di, cubit ise ka obosara-ya di kwa, o nwere akuku anọ ra nrata; cubit atọ ka idi-elu-ya di kwa.

2 O me-kwa-ra mpi-ya n’elu nkuku anọ ya; mpi-ya sitere na ya: ọ machita ya ọla.

3 O me-kwa-ra ihe nile nke ebe-ichu-aja ahu, bú ite-ya nile, na osekè-ya nile, na ọkwa-nwusa-ya nile, na ndudu-ya nile, na ihe-igu-ọku-ya nile: ihe-ya nile ka o ji ọla me.

4 O we mere ebe-ichu-àjà ahu ihe-ọkpukpa, ihe eji ub͕u ọla me, n’okpuru ebe dipuru adipu buruburu ya n’okpuru, rue na nkera-ya.

5 O we wuara nsọtu anọ nke ihe-ọkpukpa ọla ahu nb͕a-aka anọ, ibu ọnọdu inara nkpa-n’aka-ya abua.

6 O me-kwa-ra nkpa-n’aka osisi acacia, machita ha ọla.

7 O me ka nkpa-n’aka ahu ba na nb͕a-aka ahu n’elu akuku abua nke ebe-ichu-àjà ahu, ka ewe were ha nēbu ya; o were ibo me ya ka ọ di ka ib͕e.

8 O me-kwa-ra ite ọsisa-miri, ọ bu ọla, ukwu-ala-ya bu kwa ọla: ọ bu enyo nke ndinyom nēzukọ n’usu n’usu, ndi nēzukọ n’usu n’ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, ka o ji me ya.

9 O me-kwa-ra ogige ahu: akuku Ndida nke chere iru na Ndida nwere ákwà-ngechi ogige ahu nke ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ọgu cubit ise n’ogologo:

10 ide-ha di orú, ukwu-ha di kwa orú, ha bu ọla; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha bu ọla-ọcha.

11 Akuku Ugwu nwe-kwa-ra ọgu cubit ise, ide-ha di orú, ukwu-ha di kwa orú, ha bu ọla; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha bu ọla-ọcha.

12 Akuku Ọdida-anyanwu nwe-kwa-ra ákwà-ngechi nke ọgu cubit abua na iri, ide-ha di iri, ukwu-ha di kwa iri; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha bu ọla-ọcha.

13 Akuku Iru-anyanwu chere iru n’ọwuwa-anyanwu, nwekwara ọgu cubit abua na iri.

14 Ákwà-ngechi cubit iri na ise ka otù akuku ọnu-uzọ-ama-ya nwere; ide-ha di atọ, ukwu-ha di kwa atọ;

15 akuku nke-ọzọ nke ọnu-uzọ-ama-ya nwekwara: n’aka-nri na n’aka-ekpe nke ọnu-uzọ-ama ogige ahu ka ákwà-ngechi cubit iri na ise di; ide-ha di atọ, ukwu-ha di kwa atọ.

16 Ákwà-ngechi nile nke ogige ahu buruburu bu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma.

17 Ukwu nile nke ide ahu nwere bu ọla; nkpọye nile nke ide na ngegide nile ha bu ọla-ọcha; ihe amachitara isi-ha bu kwa ọla-ọcha; ihe ahu bu kwa ihe egegidere ngegide ọla-ọcha, bú ide nile nke ogige ahu.

18 Ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ-ama ogige ahu bu ọlu onye-ọdudu-ákwà, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma: orú cubit ka ogologo-ya di, idi-elu-ya nime obosara-ya di cubit ise, dika ákwà-ngechi nke ogige ahu.

19 Ide-ha di anọ, ukwu-ha di kwa anọ, ha bu ọla; nkpọye nile ha bu ọla-ọcha, ihe-nmachita nke isi-ha na ngegide nile ha bu kwa ọla-ọcha.

20 Ma ǹtú nile ebe-obibi ahu nwere, na nke ogige ahu buruburu nwere, bu ọla.

21 Ndia bu ngukọta ihe ebe-obibi ahu, bú ebe-obibi nke ihe-àmà ahu, dika agukọtara ha, n’okwu-ọnu Moses, ọ bu òfùfè nke ndi Livai, site n’aka Itama, bú nwa Eron onye-nchu-àjà.

22 Ma Bezalel nwa Uri, nwa Hua, nke ebo Juda, mere ihe nile Jehova nyere Moses n’iwu.

23 Ma onye soro ya n’ọlu ahu bu Ọhọliab, nwa Ahisamak, nke ebo Dan, bú onye nātu akika, na onye-ọ̀kà, na onye-ọdudu-ákwà n’ogho anunu, na n’ogho ododo, na n’ogho uhie, na n’ezi ákwà ọcha.

24 Ọla-edo nile nke ejiri je ozi ahu n’ije-ozi nile nke ebe nsọ ahu, bú ọla-edo nke àjà-ofufé ahu, di orú talent na iteghete, na nnù shekel na ọgu iri na ọgu isi na iri, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di.

25 Ọla-ọcha nke ndi agukọtara agukọta n’etiti nzukọ Israel di ọgu talent ise, na nnù shekel anọ na ọgu asatọ na iri na ise, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di:

26 otù beka otù isi, ya bu nkera shekel, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di, enyere n’isi onye ọ bula nke nāgabiga n’ebe ndi agukọtara agukọta nọ, site n’onye b͕ara orú arọ we gaba n’iru, n’isi orú nnù ọgu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù asatọ, na ọgu iri-na-asa, na iri.

27 Ọgu talent ọla-ọcha ise ahu we buru iwu ukwu nile nke ibo nke ebe nsọ ahu, na ukwu nile nke ide nke ákwà-nb͕ochi ahu; ọgu ukwu ise ka ọgu talent ise ahu nwere, otù talent diri otù ukwu.

28 Nnù shekel anọ na ọgu asatọ na iri na ise ahu ka o ji kwa mere ide ahu nile nkpọye, machita kwa isi-ha, mekwara ha ihe-ngegide.

29 Ọla nke àjà-ofufé ahu di kwa ọgu talent atọ na iri, na nnù shekel isi.

30 O ji ya me ukwu nile nke ide ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, na ebe-ichu-àjà ọla, na ihe-ọkpukpa ọla nke diri ya, na ihe nile nke ebe-ichu-aja ahu,

31 na ukwu nile nke ide ogige ahu buruburu, na ukwu nile nke ide ọnu-uzọ-ama ogige ahu, na ǹtú nile nke ebe-obibi ahu, na ǹtú nile nke ogige ahu buruburu.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 39

1 Ha site-kwa-ra n’ogho anunu ahu, na ogho ododo ahu, na ogho uhie ahu, me uwe nile akpara nke-ọma, iji je ozi n’ebe nsọ ahu, me kwa uwe nsọ nile nke Eron nwere; dika Jehova nyere Moses iwu.

2 Ọ mekwara ephod ahu, ọ bu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma.

3 Ha we tisa mbadamba ihe ọla-edo ahu, we bìri ya ka ọ buru eriri, ikpa n’etiti ogho anunu ahu, na n’etiti ogho ododo ahu, na n’etiti ezi ákwà ọcha ahu, ọ bu ọlu onye-ọ̀kà.

4 Ha we mere ya ubu abua ejikọtara: na nsọtu-ya abua ka ejikọtara ya.

5 Ihe-ọkiké ahu nke onye-ọ̀kà kpara, nke di n’elu ya, nke eji ke ya, o site-kwa-ra na ya, ọ di kwa ka ọlu aluru ya si di; ọ bu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma; dika Jehova nyere Moses iwu.

6 Ha mekwara nkume onyx ahu, nke emere ka ihe ọla-edo akpara akpà b͕a ha buruburu, nke eb͕uru ha eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, dika aha umu Israel si di.

7 O tiye ha n’elu ubu ephod, iburu umu Israel nkume ncheta: dika Jehova nyere Moses iwu.

8 Ọ mekwara ihe-ib͕ochi-obi ahu, ọ bu ọlu nke onye-ọ̀kà, dika ọlu aluru n’ephod ahu; ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma.

9 Ihe nwere akuku anọ ra nrata ka o bu; ha mere ihe-ib͕ochi-obi ahu ka ọ buru ihe apiajiri apiaji: ntù-aka ka ogologo-ya di, ntù-aka ka obosara-ya di kwa, mb͕e apiajiri ya.

10 Ha hiọgide-kwa-ra nime ya ariri nkume anọ: ariri sardius na topaz na carbuncle bu ariri mbu.

11 Ariri nke-abua bu emerald na sapphire na diamond.

12 Ariri nke-atọ bu jacinth na agate na amethyst.

13 Ariri nke-anọ bu beryl na onyx na jasper: etiyere ha n’ọla-edo akpara akpà n’ebe-nhiọgide-ha.

14 Nkume ahu di ka aha umu Israel si di, iri na abua, dika aha-ha si di; dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, onye ọ bula dika aha-ya si di, ha diri ebo iri na abua ahu.

15 Ha mekwara n’elu ihe-ib͕ochi-obi ahu iyab͕a emere dika eriri-nma, bú ihe emere dika udọ̀ aturu atu, ha bu ọla-edo anāgwaghi agwa.

16 Ha me-kwa-ra ihe ọla-edo abua akpara akpà, na nb͕a-aka ọla-edo abua: ha we tiye nb͕a-aka abua ahu n’elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi.

17 Ha tiye-kwa-ra iyab͕a ọla-edo abua ahu aturu atu dika udọ̀ n’elu nb͕a-aka abua ahu di na nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi ahu.

18 Nsọtu abua ọzọ nke iyab͕a abua ahu aturu atu dika udọ̀, ha tiye-kwa-ra ha n’elu ihe ọla-edo abua ahu akpara akpà, tiye ha n’elu ubu ephod ahu, n’ebe iru-ya di.

19 Ha mekwara nb͕a-aka ọla-edo abua, tukwasi ha n’elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi ahu, n’ọnu-ọnu-ya, nke chere iru n’akuku ephod ahu nime.

20 Ha mekwara nb͕a-aka ọla-edo abua, tiye ha n’elu ubu abua nke ephod n’okpuru, n’ebe iru-ya di, na nso njikọta-ya, n’elu ihe-ọkiké ephod nke onye-ọ̀kà kpara.

21 Ha were kwa eriri-nma ogho anunu ke ihe-ib͕ochi-obi ahu na nb͕a-aka ephod site na nb͕a-aka-ya, ka ọ we di n’elu ihe-ọkiké ephod ahu nke onye-ọ̀kà kpara, ya na ka ewe ghara isi n’ephod tọpu ihe-ib͕ochi-obi ahu; dika Jehova nyere Moses iwu.

22 Ó mekwara uwe-nwuda ephod, ọ bu ọlu ọkpa-akwà, ọ busi ogho anunu ogho anunu;

23 ọnu uwe-nwuda ahu di n’etiti ya, dika ọnu nke uwe-obi agha, ọnu-ọnu ka ọnu-ya nwere buruburu, ka ewe ghara idọwa ya.

24 Ha mekwara n’ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu pomegranate nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ákwà akpara nke-ọma.

25 Ha mekwara ataṅu ọla-edo anāgwaghi agwa, tiye ataṅ ahu n’etiti pomegranate ahu n’elu ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu buruburu, n’etiti pomegranate ahu;

26 otù ataṅu na otù pomegranate, otù ataṅ na otù pomegranate, di n’ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu buruburu, iji je ozi; dika Jehova nyere Moses iwu.

27 Ha we mere Eron, mekwara umu-ya ndikom, uwe-ime ahu, ha bu ezi ákwà ọcha, ọlu nke ọkpa-ákwà,

28 na ákwà-nkukù-isi ahu, ọ bu ezi ákwà ọcha, na ihe ahu mara nma ike n’isi, ha bu ezi ákwà ọcha, na uwe-ukwu ahu nke ezi ákwà ọcha, ha bu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma,

29 na ihe ahu ike n’úkwù, ọ bu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, ọ bu ọlu nke onye-ọdudu-ákwà; dika Jehova nyere Moses iwu.

30 Ha mekwara ihe di mbara nke okpu nsọ ahu nke onye-nchu-àjà, ọ bu ọla-edo anāgwaghi agwa, ha de ihe-odide n’elu ya, dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, IHE NSỌ JEHOVA NWERE.

31 Ha tiye-kwa-ra n’elu ya eriri-nma ogho anunu, itiye ya n’elu ákwà-nkukù-isi ahu n’elu; dika Jehova nyere Moses iwu.

32 Ewe me ka òfùfè nile nke ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute gwusia: umu Israel we me dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n’iwu, otú a ka ha mere.

33 Ha we butere Moses ebe-obibi ahu, Ulo-ikwū ahu, na ihe-ya nile, nko-ya nile, na ibo-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na ukwu-ya nile;

34 na ihe-nkpuchi akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na ihe-nkpuchi akpukpọ seal, na ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi-ya;

35 na ib͕e ihe-àmà ahu, na nkpa-n’aka-ya abua, na ebe-nkpuchi-nmehie ahu;

36 na table ahu, na ihe-ya nile, na achicha nke iru Chineke;

37 na ihe-idọba-oriọna ahu nke bu ọla-edo anāgwaghi agwa, na oriọna-ya nile, bú oriọna nke ido n’usoro, na ihe-ya nile, na manu nke ihe nēnye ìhè;

38 na ebe-ichu-àjà ọla-edo ahu, na manu otite-manu ahu, na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ Ulo-ikwū ahu;

39 na ebe-ichu-àjà ọla ahu, na ihe-ọkpukpa ọla nke o nwere, na nkpa-n’aka-ya abua, na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu, na ukwu-ala-ya;

40 na ákwà-ngechi nile nke ogige ahu, na ide-ya nile, na ukwu ide-ya, na ákwà-nkwuchi ọnu-uzọ-ama ogige ahu nwere, na udọ̀-ya nile, na ǹtú-ya nile, na ihe nile nke òfùfè ebe-obibi ahu, nke diri ulo-ikwū nzute ahu;

41 na uwe nile akpara nke-ọma, iji je ozi n’ebe nsọ ahu, na uwe nsọ nile Eron onye-nchu-àjà nwere, na uwe nile nke umu-ya ndikom, ibu ndi-nchu-àjà.

42 Dika ihe nile Jehova nyere Moses n’iwu si di, otú a ka umu Israel jere ozi-ya nile.

43 Moses we hu ojije-ozi ahu nile, ma, le, ha ejewo ya; dika Jehova nyere iwu, otú a ka ha jere ya: Moses we gọzie ha.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 40

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 N’ubọchi mbu nke ọnwa mbu ka i gēguzo ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute ahu ọtọ.

3 I gādọba kwa n’ebe ahu ib͕e ihe-àmà ahu, i gēji kwa ákwà-nb͕ochi ahu kwuchi ib͕e ahu.

4 I gēwebata kwa table ahu, do ihe ya n’usoro; i gēwe-bata kwa ihe-idọba-oriọna ahu, weli kwa oriọna-ya nile.

5 I gētiye kwa ebe-ichu-àjà ọla-edo isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’iru ib͕e ihe-àmà ahu, tukwasi kwa ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ n’ebe-obibi ahu.

6 I gētiye kwa ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku ahu n’iru ọnu-uzọ nke ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute ahu.

7 I gētiye kwa ite ọsisa-miri ahu n’etiti ulo-ikwū nzute ahu na ebe-ichu-àjà ahu, tiye miri n’ebe ahu.

8 I gēdebe kwa ogige ahu buruburu, tiye ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ-ama ogige ahu.

9 I gēwere kwa manu otite-manu ahu te ebe-obibi ahu, na ihe nile nke di nime ya, i gēdo kwa ya nsọ, na ihe-ya nile: ọ gādi kwa nsọ.

10 I gēte kwa ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku ahu manu, ya na ihe-ya nile, do ebe-ichu-àjà ahu nsọ: ebe-ichu-àjà ahu gābu ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile.

11 I gēte kwa ite ọsisa-miri ahu na ukwu-ala-ya manu, do ya nsọ.

12 I gēme kwa Eron na umu-ya ndikom ka ha biarue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute ahu nso, i gēwere kwa miri sa ha aru.

13 I gēyikwasi kwa Eron uwe nsọ ahu; i gēte kwa ya manu, do ya nsọ, ka o we burum onye-nchu-àjà.

14 Ọ bu kwa umu-ya ndikom ka i gēme ka ha biarue nso, i gēyikwasi kwa ha uwe-ime:

15 i gēte kwa ha manu, dika i tere nna-ha, ka ha we burum ndi-nchu-àjà: otite-manu-ha aghaghi iburu ha ọlu-nchu-àjà ebighi-ebi rue ọb͕ọ-ha nile.

16 Moses we me ya: dika ihe nile si di nke Jehova nyere ya n’iwu, otú a ka ọ mere.

17 O rue n’ọnwa mbu n’arọ nke-abua, n’ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na eguzoro ebe-obibi ahu ọtọ.

18 Moses we guzo ebe-obibi ahu ọtọ, tiye ukwu-ya nile, guzo ibo-ya nile ọtọ, tiye nkpọrọ-ya nile, guzo ide-ya nile ọtọ.

19 Ọ we b͕asa ulo-ikwū ahu n’elu ebe-obibi ahu, tukwasi ya ihe-nkpuchi nke ulo-ikwū ahu n’elu; dika Jehova nyere Moses iwu.

20 O were ihe-àmà ahu tiye n’ib͕e ahu, tukwasi nkpa-n’aka-ya abua n’ib͕e ahu, tiyekwasi ebe-nkpuchi-nmehie n’ib͕e ahu n’elu:

21 o webata ib͕e ahu n’ebe-obibi ahu, do ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi ahu, we kwuchi ib͕e ihe-àmà ahu; dika Jehova nyere Moses iwu.

22 O tiye table ahu n’ulo-ikwū nzute, n’akuku ebe-obibi ahu chere iru n’Ugwu, n’èzí ákwà-nb͕ochi ahu.

23 O do usoro achicha n’usoro n’elu-ya n’iru Jehova; dika Jehova nyere Moses iwu.

24 Ọ dọba ihe-idọba-oriọna ahu nime ulo-ikwū nzute, na ncherita-iru table, n’akuku ebe-obibi ahu chere iru na Ndida.

25 O welie oriọna ahu nile n’iru Jehova; dika Jehova nyere Moses iwu.

26 O tiye ebe-ichu-àjà ọla-edo ahu n’ulo-ikwū nzute n’iru ákwà-nb͕ochi ahu:

27 o we sure n’elu ya ihe-nsure-oku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me; dika Jehova nyere Moses iwu.

28 Ọ tukwasi ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ n’ebe-obibi ahu.

29 Ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku ka ọ dọba-kwa-ra n’ọnu-uzọ ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute, we sure n’elu ya àjà-nsure-ọku ahu na onyinye-inata-iru-ọma ahu; dika Jehova nyere Moses iwu.

30 Ọ dọba ite ọsisa-miri ahu n’etiti ulo-ikwū nzute na ebe-ichu-àjà, tiye miri n’ebe ahu, iji sa aru.

31 Moses na Eron na umu-ya ndikom we sa aka-ha na ukwu-ha site na ya:

32 mb͕e ha nābà n’ulo-ikwū nzute, na mb͕e ha nābiaru ebe-ichu-àjà nso, ha we sa aru: dika Jehova nyere Moses iwu.

33 O guzo-kwa-ra ogige ahu ọtọ buru-buru ebe-obibi ahu na ebe-ichu-àjà ahu, tiye ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ-ama ogige ahu. Moses we jesia ozi ahu.

34 Igwe-oji ahu we kpuchie ulo-ikwū nzute, ebube Jehova we juputa ebe-obibi ahu.

35 Moses apughi kwa ibà n’ulo-ikwū nzute, n’ihi na igwe-oji ahu biri n’elu ya, ebube Jehova juputa-kwa-ra ebe-obibi ahu.

36 Mb͕e ọ bula emere ka igwe-oji ahu si n’elu ebe-obibi ahu rigo, umu Israel we bulie ije, nime nbuli-ije-ha nile:

37 ma ọ buru na emeghi ka igwe-oji ahu rigo, ha adighi-ebuli kwa ije rue ubọchi emere ka ọ rigo.

38 N’ihi na igwe-oji nke Jehova di n’elu ebe-obibi ahu n’ehihie, ọku di kwa nime ya n’abali, n’anya ulo Israel nile, nime nbuli-ije-ha nile.