Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 21

1 Ma ndia bu ikpé nke i gētiye n’iru ha.

2 Mb͕e i b͕ata orù, bú onye-Hibru, arọ isi ka ọ gābu orù-gi: ma n’arọ nke-asa ọ gāpu nwere onwe-ya n’efu.

3 Ọ buru na ọ bata nání ya, ọ gāpu nání ya: ọ buru na onye nwere nwunye ka ọ bu, nwunye-ya gēso kwa ya pua.

4 Ọ buru na onye-nwe-ya enye ya nwunye, nwayi ahu ewe muara ya umu-ndikom ma-ọbu umu-ndinyom; nwayi ahu na umu-ya gābu ihe onye-nwe-ya nwere, ma ọ gapu nání ya.

5 Ma ọ buru na orù ahu asi n’ezie, Ahurum onye-nwem na nwunyem na umum n’anya; m’gaghi-apu nwere onwem:

6 onye-nwe-ya gēme kwa ka ọ biakute Chineke nso, ọ gēme kwa ka ọ biarue nso ọnu-uzọ, ma-ọbu nso awara-uzọ; onye-nwe-ya gēwere arà rapue nti-ya; ọ gābu kwa orù-ya rue mb͕e ebighi-ebi.

7 Ma mb͕e nwoke gēre nwa-ya nwayi ka ọ buru orù-nwayi, ọ gaghi-apu dika ọpupu orù-ndikom.

8 Ọ buru na ọ jọ njọ n’anya onye-nwe-ya, bú onye kwere na ya onwe-ya gālu ya na nwunye, ọ gēkwe kwa ka ab͕aputa ya: ọ gaghi-enwe ike ire ya nye ndi ala ọzọ, n’ihi na ọ ghọb͕uru ya.

9 Ma ọ buru na ọ kwere na nwa-ya nwoke gālu ya, dika ihe ekpere n’ikpe bayere umu-ndinyom si di, otú a ka ọ gēme ya.

10 Ọ buru na ọ lutara ya nwunye ọzọ; ọ gaghi-ewebì anu-oriri-ya, na ihe-nb͕okwasi-ya, na ihe kwesiri ya dika nwunye.

11 Ma ọ buru na ọ meghi ihe atọ ndia nye ya, ọ gāpu kwa n’efu, nēnyeghi ego.

12 Onye nētib͕u madu, ọ we nwua, aghaghi ime ka ọ nwua.

13 Ma onye nēcheghi anwu, ma Chineke mere ka ọ dabà n’aka-ya; M’gēdoro gi ebe ọ gāb͕alaga.

14 Ma mb͕e onye ọ bula gēwere nganga biakwasi ibe-ya, ib͕u ya n’aghughọ; n’ebe-ichu-àjàm ka i gēwepu ya ka ọ nwua.

15 Onye nēti nna-ya, ma-ọbu nne-ya, ihe, aghaghi ime ka ọ nwua.

16 Onye nēzu madu n’ori re ya, ma-ọbu na asi na ahu ya n’aka-ya, aghaghi ime ka ọ nwua.

17 Onye nākọcha nna-ya, ma-ọbu nne-ya, aghaghi ime ka ọ nwua.

18 Mb͕e ndikom nēse okwu, ma otù nime ha ewere nkume ma-ọbu iwere ọkpọ ti ibe-ya, ma ọ nwughi, ma o dina n’ihe-ndina ọria:

19 ma ọ buru na o bilie, jeghari n’èzí, dabere na nkpa-n’aka-ya, agāgu onye tiri ya n’onye ikpé nāmagh: ọ bu nání na ọ gēnye ya ihe bayere nb͕uru-ya, me kwa ka aru-ya di ike nke-ọma.

20 Mb͕e onye ọ bula gēwere nkpa-n’aka ti orù-ya nwoke, ma-ọbu orù-ya nwayi, ọ we nwua n’okpuru aka-ya; aghaghi ibọ ọ́bọ̀-ya n’aru ya.

21 Ma otú ọ di, ọ buru na otù ubọchi ma-ọbu ubọchi abua ka ọ gānọru, agaghi-abọ ọ́bọ̀-ya n’aru ya: n’ihi na ego-ya ka ọ bu.

22 Mb͕e ndikom nālu ọgu, we tie nwayi di ime ihe, ime-ya we pua, ma ajọ ihe aputagh: aghaghi iri ya nra, dika di nwayi ahu gātukwasi ya; ọ gēnye kwa site n’aka ndi-ikpé.

23 Ma ọ buru na ajọ ihe aputa, i gēme kwa ka ndu lara ndu,

24 anya lara anya, ezé lara ezé, aka lara aka, ukwu lara ukwu,

25 ida-ọku lara ida-ọku, ob͕ub͕u-mma lara ob͕ub͕u-mma, ufiri-utari lara ufiri-utari.

26 Mb͕e onye ọ bula gēti anya orù-ya nwoke, ma-ọbu anya orù-ya nwayi, ihe, we bibie ya; o gēzipu kwa ya ka ọ nwere onwe-ya n’ihi anya-ya.

27 Ọ buru kwa na ọ me ka ezé orù-ya nwoke ma-ọbu ezé orù-ya nwayi dapu; ọ gēzipu kwa ya ka o nwere onwe-ya n’ihi ezé-ya.

28 Mb͕e ehi gāsọ nwoke ma-ọbu nwayi mpì, o we nwua, aghaghi itub͕u ehi ahu na nkume, agaghi-eri kwa anu-ya; ma agāgu onye-nwe ehi ahu n’onye ikpe nāmaghi.

29 Ma ọ buru na ehi ahu bu ehi nāsọ mpì na mb͕e gara aga, ewe b͕ara onye-nwe-ya àmà, ma o debeghi ya nke-ọma, kama o mere ka nwoke ma-ọbu nwayi nwua; agātub͕u ehi ahu na nkume, ọzọ kwa, agēme ka onye-nwe-ya nwua.

30 Ọ buru na ihe ikpuchi nmehie-ya ka agātukwasi ya, ọ gēnye ihe-nb͕aputa nke ndu-ya, dika ihe nile agātukwasi ya si di.

31 Ma ọ bu nwa-nwoke ka ọ sọrọ mpì, ma ọ bu nwa-nwayi ka ọ sọrọ mpì, dika ikpé a si di ka agēme ya.

32 Ọ buru na orù-nwoke ma-ọbu orù-nwayi ka ehi ahu sọrọ mpì; orú shekel ọla-ọcha na iri ka ọ gēnye onye-nwe-ya, agātub͕u kwa ehi ahu.

33 Mb͕e onye ọ bula gēmeghe olùlù, ma-ọbu mb͕e onye ọ bula gēgwu olùlù, ghara imechi ya, ehi ma-ọbu inyinya-ibu ewe dabà nime ya,

34 onye-nwe olùlù ahu gākwughachi ihe; ego ka ọ gēnyeghachi onye-nwe-ya, nke nwuru anwu gābu kwa nke aka ya.

35 Mb͕e ehi onye ọ bula gēmeru ehi nke madu-ibe-ya aru, ọ we nwua; ha gēre kwa ehi di ndu, kè ego-ya: ọzọ kwa, nke nwuru anwu ka ha gēkè.

36 Ma-ọbu asi na amara na ehi ahu bu ehi nāsọ mpì na mb͕e gara aga, ma onye-nwe-ya edebeghi ya nke-ọma; ọ ghaghi ikwughachi ehi n’ọnọdu ehi ahu, nke nwuru anwu gābu kwa nke aka ya.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 22

1 Mb͕e onye ọ bula gēzu ehi ma-ọbu aturu, we b͕ue ya, ma-ọbu re ya; ehi ise ka ọ gākwughachi n’ọnọdu ehi ahu, ma-ọbu aturu anọ ka ọ gākwughachi n’ọnọdu aturu ahu.

2 Ọ buru na ahú onye-ori ka ọ nētipú ulo, ewe tib͕ue ya, o we nwua, ọ dighi ikpe-ọmuma ọbara gādi bayere ya.

3 Ọ buru na anyanwu awakwasi ya, ikpe-ọmuma ọbara gādi bayere ya: ọ ghaghi ikwu-ghachi; ọ buru na o nweghi ihe, agēre kwa ya n’ihi ori-ya.

4 Ọ buru na achọta ihe ahu n’aka-ya n’ezie, bú nke o zuru n’ori, ma ọ bu ehi, ma-ọbu inyinya-ibu, ma-ọbu aturu, na ndu; ọ gākwughachi okpukpu abua.

5 Mb͕e onye ọ bula gēme ka anumanu ta nri n’ubi ma-ọbu n’ubi-vine, o we zipu anumanu-ya, o we ta nri n’ubi onye ọzọ; ihe kachasi nma nke ubi-ya, na ihe kachasi nma nke ubi-vine-ya, ka ọ gākwughachi.

6 Mb͕e ọku gāb͕a, we b͕akuru ogwu, ọku ahu we richapu obo ọka, ma-ọbu ọka guzoro eguzo, ma-ọbu ọhia; onye mere ka ọku ahu b͕a aghaghi ikwughachi.

7 Mb͕e onye ọ bula gēnye ibe-ya ego ma-ọbu ihe idebe, ewe zue ya n’ulo nwoke ahu; ọ buru na achọta onye-ori ahu, ọ ghaghi ikwughachi okpukpu abua.

8 Ọ buru na achọtaghi onye-ori ahu, onye-nwe ulo ahu gābiakute Chineke nso, imara ma o setipughi aka-ya n’aru ihe madu-ibe-ya jetara n’ozi.

9 Okwu bayere ihe-njehie ọ bula, ma ọ bu okwu bayere ehi, bayere inyinya-ibu, bayere aturu, bayere uwe-nb͕okwasi, bayere ihe ọ bula furu efu, nke madu nāsi, Nka bu ya, Chineke ka okwu ha abua gābiakute; onye Chineke gāma ikpe, ọ gākwughachi ibe-ya okpukpu abua.

10 Mb͕e onye ọ bula gēnye ibe-ya inyinya-ibu, ma-ọbu ehi, ma-ọbu aturu, ma-ọbu anumanu ọ bula, idebe: o we nwua, ma-ọbu ihe meruru ya aru, ma-ọbu adọta ya n’agha, ma ọ dighi onye nāhu ya:

11 Iyi nke Jehova gādi n’etiti ha abua, imara ma o setipughi aka-ya n’aru ihe ibe-ya jetara n’ozi; onye-nwe anumanu ahu gānara ya, ọ gaghi-akwughachi kwa.

12 Ma o buru na ezuru ya n’ori n’aka-ya n’ezie, ọ gākwughachi onye-nwe-ya.

13 Ọ buru na anu ọhia dọb͕uru ya n’ezie, ya webata ya ka ọ buru ihe-àmà; ọ gaghi-akwughachi ihe anu-ọhia dọb͕uru.

14 Mb͕e onye ọ bula gāriọta anumanu n’aka ibe-ya, ihe we meru ya aru, ma-ọbu ọ nwua, mb͕e onye-nwe-ya nānọghi yere ya, ọ ghaghi ikwughachi.

15 Ọ buru na onye-nwe-ya nọyere ya, ọ gaghi-akwughachi: ọ buru na ọ bu ihe egoro ọlu, ọ biara n’ihi ugwọ-ọlu-ya.

16 Mb͕e nwoke gārafu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke nke ọ dighi nwoke kwere ilu ya, o we dinayere ya, ọ ghaghi inye ego ọlulu bayere ya ka ọ buru nwunye-ya.

17 Ọ buru na nna-ya ajusi ike iwere ya nye ya, ọ gākwu ego dika ego ọlulu umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke si di.

18 Ekwela ka nwayi-mb͕asi di ndu.

19 Onye ọ bula ya na anumanu nēdina, aghaghi ime ka ọ nwua.

20 Onye nāchuru chi àjà, ma-ọbughi ichuru Jehova, nání Ya, agēwezuga ya ka ebibie ya.

21 Gi emela ọbìa ihe-ike, emeb͕u-kwa-la ya: n’ihi na ndi-ọbìa ka unu buri n’ala Ijipt.

22 Nwayi ọ bula di-ya nwuru, ma-ọbu nwa-nb͕ei, unu ewedala ya n’ala.

23 Ọ buru na i weda ya n’ala ma-ọli, ọ we tikuem n’uzọ ọ bula n’ezie, aghaghm inu ntiku-ya;

24 iwem gādi ọku, M’gēwere kwa mma-agha b͕ue unu; nwunye-unu gāghọ ndinyom di-ha nwuru, umu-unu gāghọ kwa umu-nb͕ei.

25 Ọ buru na i binye onye ọ bula n’etiti ndim ego, bú onye ewedara n’ala, onye gi na ya nọ, aburula ya dika onye nānara ọmuru-nwa; unu atukwasi-kwa-la ya uma.

26 Ọ buru na i were uwe-nb͕okwasi madu-ibe-gi n’ihe-ibe ma-ọli, mb͕e ọdida-anyanwu ruru ka i gēwere ya nyeghachi ya:

27 n’ihi na nke ahu bu ihe-nb͕okwasi o nwere nání ya, nke ahu bu uwe-nb͕okwasi-ya iyikwasi n’akpukpọ-aru-ya: ọ̀ bu nime gini ka o gēdina? o gēru kwa, mb͕e ọ nētikum, na M’gānu; n’ihi na onye-amara ka M’bu.

28 Gi akọchala Chineke, abu-kwa-la onye-isi ndi-gi ọnu.

29 Alala azú inye ùjú-gi na ihe-ọṅuṅu-gi. Nwa-nwoke eburu uzọ mu nime umu-gi ndikom ka i gēnyem.

30 Otú a ka i gēmere ehi-gi, na ìgwè ewu na aturu-gi: ubọchi asa ka ya na nne-ya gānọ: n’ubọchi nke-asatọ i gēwere ya nyem.

31 Ndi di nsọ ka unu gāburum: unu eri-kwa-la anu nke anu-ọhia dọb͕uru n’ọhia; nkita ka unu gātudara ya.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 23

1 Gi eburula akukọ efu: esola onye nēmebi iwu tiye aka-gi ibu onye-àmà nke ihe-ike.

2 Esola ọtutu madu n’azu ba n’ihe ọjọ di iche iche: ab͕a-kwa-la àmà bayere ise-okwu ka i we wezuga onwe-gi iso ọtutu madu n’azu iwezuga ikpé:

3 asọpuru-kwa-la onye nēnweghi ike n’ise-okwu-ya.

4 Mb͕e i zute ehi onye-iro-gi, ma-ọbu inyinya-ibu-ya, ka ọ nākpafu, i ghaghi ime ka ọ laghachikuru ya.

5 Mb͕e i huru inyinya-ibu nke onye nākpọ gi asì ka ibu-ya nānyib͕u ya, ma i nāchọ ighara itọpuru ya ibu ahu, i ghaghi iyere ya aka itọpu ya.

6 Ewezugala ikpé nke ob͕eye-gi n’ise-okwu-ya.

7 I gānọpuru okwu-ugha n’ebe di anya; eb͕u-kwa-la onye ikpé nāmaghi na onye ezi omume: n’ihi na adighm-agu onye nēmebi iwu n’onye ezi omume.

8 Anara-kwa-la ihe-iri-ngo: n’ihi na ihe-iri-ngo nēme ka ndi nāhu uzọ kpu ìsì, ọ nēme kwa ka okwu ndi ezi omume b͕agọ ab͕agọ.

9 Emeb͕u-kwa-la ọbìa: n’ihi na unu onwe-unu amawo nkpuru-obi nke ọbìa, n’ihi na ọbìa ka unu buri n’ala Ijipt.

10 Arọ isi ka i gāgha nkpuru n’ala-gi, chikọta kwa ihe-ọmume-ya:

11 ma n’arọ nke-asa i gārapu ya, me ka ọ tọb͕ọrọ n’efu; ka ndi-ob͕eye nke ndi-gi we rie ihe: anu-ọhia gēri kwa ihe ha rifọrọ. Otú a ka i gēme kwa ubi-vine-gi, me kwa ubi-olive-gi.

12 Ubọchi isi ka i gālu ọlu-gi, ma n’ubọchi nke-asa i gākwusi n’ọlu: ka ehi-gi na inyinya-ibu-gi we zuru ike, ọzọ, ka nwa nke orù-gi nwayi na ọbìa we turu ndu.

13 Ma n’ihe nile M’siworo unu lezienu anya: unu ehota-kwa-la aha chi ọ bula ọzọ, ka aghara kwa inu ya n’ọnu-gi.

14 Ub͕ò atọ ka i gēmerem ememe n’arọ.

15 I gēdebe ememe achicha ekoghi-eko: ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko, dika M’nyere gi iwu, na mb͕e akara àkà n’ọnwa Ebib (n’ihi na ọ bu nime ya ka i siri n’Ijipt puta); ma ọ dighi onye agāhu n’irum ka ọ b͕a aka:

16 i gēdebe kwa ememe nke owuwe-ihe-ubi, bú nke nkpuru mbu nke i lutara n’ọlu, nke i nāgha n’ubi: na ememe nke nchikọta-ihe, n’ọgwugwu arọ, mb͕e i si n’ubi chikọta ihe nile i lutara n’ọlu.

17 Ub͕ò atọ n’arọ ka agāhu ndikom-i nile n’iru Onye-nwe-unu, bú Jehova.

18 Achula ọbara nke àjàm n’elu achicha koro eko; abuba nke ememem agaghi-adigide kwa abali nile rue ututu.

19 Ihe mbu nke nkpuru mbu nile nke ala-ubi-gi ka i gēwebata n’ulo nke Jehova, bú Chineke-gi. Esila nwa-ewu nime miri-ara nke nne-ya.

20 Le, Mu onwem nēziga mọ-ozi n’iru gi, idebe gi n’uzọ, na ime ka i bata n’ebe ahu M’doziworo.

21 Lezie anya n’iru ya, ge kwa nti n’olu-ya; enupula isi n’okpuru ya: n’ihi na ọ gaghi-ab͕aghara njehie-unu; n’ihi na aham di nime ya.

22 N’ihi na, ma ọ buru na i ge nti n’olu-ya n’ezie, we me ihe nile nke M’nēkwu, M’gābu-kwa-ra ndi-iro-gi onye-iro, kpab͕u kwa ndi nākpab͕u gi.

23 N’ihi na mọ-ozim ganēje n’iru gi, me ka i bakute ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Kenean, na ndi-Haivait, na ndi Jebus: M’gēzopu kwa ha n’uwa.

24 Akpọla isi ala nye chi nile ha, efè-kwa-la ha, eme-kwa-la dika omume nile ha si di: kama i gākwadasi ha, tipiasi kwa ogidi nile ha.

25 Ma unu gēfè Jehova, bú Chineke-unu, Ọ gāgọzi kwa nri-gi na miri-gi; M’gēwe-zuga kwa ọria n’etiti gi.

26 Ọ gaghi-adi nwayi nēmebi ime ma-ọbu nwayi-àgà n’ala-gi: M’gēmezu ọnu-ọgugu ubọchi-gi.

27 Oké ujọm ka M’gēziga n’iru gi, chusa ha, bú ndi ahu nile i gābakute ha, M’gēnye kwa gi olu ndi-iro-gi nile.

28 M’gēziga kwa ebu n’iru gi, ha gāchupu ndi-Haivait, na ndi Kenean, na ndi Het, n’iru gi.

29 M’gaghi-achupu ha n’iru gi n’otù arọ; ka ala we ghara ighọ ihe tọb͕ọrọ n’efu, anu-ọhia ewe ba uba megide gi.

30 Nwantī nwantī ka M’gāchupu ha n’iru gi, rue mb͕e i gāmu ọmùmù, we keta ala ahu.

31 M’gētiye kwa ókè-ala-gi site n’Oké Osimiri Uhie we rue oké osimiri ndi Filistia, site kwa n’ọzara rue Osimiri Yufretis: n’ihi na M’gēwere ndi bi n’ala ahu nye n’aka-unu; i gāchupu kwa ha n’iru gi.

32 Gi na ha ab͕ala ndu, gi na chi-ha ab͕a-kwa-la ndu.

33 Ha agaghi-ebi n’ala-gi, ka ha we ghara ime ka i mehie megidem: n’ihi na ọ buru na i fè chi-ha, ọ ghaghi iburu gi ọnyà.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 24

1 Moses ka Ọ siri, Rigokute Jehova, gi onwe-gi, na Eron, na Nedab, na Abaihu, na ọgu madu atọ na iri sitere na ndi-okenye ndi Israel; unu gākpọ kwa isi ala n’ebe di anya:

2 ma nání Moses onwe-ya gābiakute Jehova nso; ma ha onwe-ha agaghi-abiaru nso; ndim agaghi-eso kwa ya rigota.

3 Moses we bia, kọrọ ndi Israel okwu Jehova nile, na ikpé-Ya nile; ndi Israel nile we za n’otù olu, si, Okwu nile Jehova kwuworo, ayi gēme ha.

4 Moses we de okwu Jehova nile n’akwukwọ, o bilie n’isi-ututu, wu ebe-ichu-àjà n’okpuru ugwu ahu, ya na ogidi iri na abua, dika ebo iri na abua nke Israel si di.

5 O zie umu-okorọbia nke umu Israel, ha we sure àjà-nsure-ọku, chiri kwa oke-ehi chuara Jehova àjà, bú àjà-udo.

6 Moses we were nkera ọbara-ha, tiye n’ọkwa di iche iche; nkera ọbara-ha ka ọ wusara n’ebe-ichu-àjà.

7 Ọ were akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu ahu, gua ya na nti ndi Israel: ha we si, Ihe nile Jehova kwuworo, ayi gēme ya, nu kwa.

8 Moses we were ọbara ahu, wusa ya n’aru ndi Israel, si, Le, ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, nke Jehova b͕aworo n’ebe unu nọ bayere okwu ndia nile.

9 Moses we rigo, ya na Eron na Nedab na Abaihu, na ọgu madu atọ na iri sitere na ndi-okenye nke Israel:

10 ha we hu Chineke nke Israel; ma n’okpuru ukwu-Ya abua ọ di ka pavement eji nkume sapphire me, ọ di kwa ka elu-igwe onwe-ya n’idi-ọcha.

11 Ma Ọ setipughi aka-Ya megide ndi ahu arọputara n’etiti umu Israel: ha we hu Chineke anya, rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu.

12 Jehova we si Moses, Rigokutem rue ugwu a, nọ kwa n’ebe ahu: ka M’nye kwa gi nkume abua ahu di mbadamba, na iwum, na ihe M’nyere n’iwu, bú nke M’deworo, ka i we zí ha.

13 Moses we bilie, ya na Joshua onye nējere ya ozi: Moses we rigo n’ugwu nke Chineke.

14 Ma ndi-okenye Israel ka ọ siri, Nọdunu n’ebe a nēche ayi, rue mb͕e ayi gālaghachikute unu: ma, le, Eron na Hua nọ n’etiti unu: onye nwere okwu, ya biakute ha nso.

15 Moses we rigo n’ugwu ahu, igwe-oji ahu we kpuchie ugwu.

16 Ebube Jehova biri n’elu ugwu Sainai, igwe-oji ahu nēkpuchi kwa ya ubọchi isi: O si n’etiti igwe-oji ahu kpọ Moses òkù n’ubọchi nke-asa.

17 Ma nile ebube Jehova anya, ọ di ka ọku nērichapu n’elu ugwu ahu n’anya umu Israel.

18 Moses we ba n’etiti igwe-oji ahu, rigorue ugwu ahu: Moses we nọ n’ugwu ahu ọgu ubọchi abua ehihie na abali.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 25

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Gwa umu Israel ka ha wetara m àjà-nbuli: n’aka nwoke ọ bula nke obi-ya nēme ya ka ọ nwe afọ-ofufo ka unu gānara àjà-nbulim.

3 Nka bu kwa àjà-nbuli ahu nke unu gānara n’aka ha; ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla;

4 na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, na aji ewu;

5 na akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na akpukpọ seal, na osisi acacia;

6 na manu itiye n’ihe nēnye ìhè, na uda di iche iche itiye na manu nke otite-manu ahu, na ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ me;

7 na nkume onyx, na nkume di iche iche ihiọgide n’ihe, ihiọgide n’ephod na ihiọgide n’ihe-ib͕ochi-obi.

8 Ka ha me-kwa-ram ebe nsọ; ka M’we biri n’etiti ha.

9 Dika ihe nile Mu onwem nēme ka i hu, bú ihe-atù nke ebe-obibim, na ihe-atù nke ihe-ya nile, ọbuná otú a ka unu gēme ya.

10 Ha gēme kwa ib͕e osisi acacia: cubit abua na nkera ka ogologo-ya gādi, otù cubit na nkera ka obosara-ya gādi, otù cubit na nkera ka idi-elu-ya gādi.

11 I gāmachita kwa ya ọla-edo anāgwaghi agwa, nime na azu ka i gāmachita ya, i gēme kwa mpempe ọla-edo n’elu-ya buruburu.

12 I gāwu-kwa-ra ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, tiye ha n’ukwu anọ ya; bú nb͕a-aka abua n’otù akuku-ya, na nb͕a-aka abua n’akuku-ya ọzọ.

13 I gēme kwa nkpa-n’aka osisi acacia, machita ha ọla-edo.

14 I gēme kwa ka nkpa-n’aka ahu ba na nb͕a-aka ahu n’elu akuku ib͕e ahu, iwere ha nēbu ib͕e ahu.

15 Nime nb͕a-aka nke ib͕e ahu ka nkpa-n’aka ahu ganādi: agaghi-ewepu ha nime ya.

16 I gētiye kwa n’ib͕e ahu ihe-àmà M’gēnye gi.

17 I gēme kwa ebe-nkpuchi-nmehie nke ọla-edo anāgwaghi agwa: cubit abua na nkera ka ogologo-ya gādi, otù cubit na nkera ka obosara-ya gādi.

18 I gēme kwa cherubim ọla-edo abua; ihe akpuru akpu ka i gēme ha, na nsọtu abua nke ebe-nkpuchi-nmehie.

19 Gi me otù cherub n’otù nsọtu, na otù cherub na nsọtu nke-ọzọ: site n’ebe-nkpuchi-nmehie ka unu gēme cherubim ahu n’elu nsọtu-ya abua.

20 Cherubim ahu ganāb͕asa kwa nkù-ha n’elu, nēkpuchi ebe-nkpuchi-nmehie na nkù-ha, iru-ha nēcherita kwa onwe-ha; n’ebe ebe-nkpuchi-nmehie di ka iru cherubim ahu gādi.

21 I gātukwasi kwa ebe-nkpuchi-nmehie ahu n’ib͕e ahu, n’elu ya; nime ib͕e ahu ka i gētiye ihe-àmà nke M’gēnye gi.

22 M’gēzute kwa gi n’ebe ahu, kpayere gi uka site n’elu ebe-nkpuchi-nmehie, site n’etiti cherubim abua nke di n’elu ib͕e ihe-àmà ahu, bayere ihe nile nke M’gēnye gi n’iwu n’ebe umu Israel nọ.

23 I gēme kwa table osisi acacia: cubit abua ka ogologo-ya gādi, otù cubit ka obosara-ya gādi, otù cubit na nkera ka idi-elu-ya gādi.

24 I gāmachita kwa ya ọla-edo anāgwaghi agwa, me-kwa-ra ya mpempe ọla-edo buruburu.

25 I gēme-kwa-ra ya ihe-njikọ buruburu nke ra ka otù ọbu-aka, i gēme-kwa-ra ihe-njikọ-ya mpempe ọla-edo buruburu.

26 I gēme-kwa-ra ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, tiye nb͕a-aka ahu na nkuku ano nke di n’ukwu anọ ya.

27 Na nso ihe-njikọ ahu ka nb͕a-aka gādi, ka ha buru ọnọdu itiye nkpa-n’aka eji ebu table ahu.

28 I gēji kwa osisi acacia me nkpa-n’aka ahu, i gāmachita kwa ha ọla-edo, agēji ha ebu table.

29 I gēme kwa afere-ya nile, na ngaji-ya nile, na iko-ya nile, na ọkwa-ya nile, nke eji awusi àjà-ihe-ọṅuṅu: ọla-edo anāgwaghi agwa ka i gēwere me ha.

30 I gādọba kwa achicha nke iru Chineke n’elu table ahu n’irum mb͕e dum.

31 I gēme kwa ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo anāgwaghi agwa: ihe akpuru akpu ka agēme ihe-idọba-oriọna ahu, bú ukwu-ala-ya, na alaka-ya; iko-ya nile, bú isi-ya nile, na okoko-ya nile, gēsite na ya:

32 alaka isi ganēsi n’akuku-ya abua waputa; alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu n’otù akuku-ya, alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu kwa n’akuku-ya nke-ọzọ:

33 iko atọ emere dika ifuru osisi almond gādi n’otù alaka, otù isi na otù okoko; iko atọ emere dika ifuru osisi almond gādi kwa n’alaka-ibe-ya, otù isi na otù okoko: otú a ka ọ gādiri alaka isi ahu nke nēsi n’ihe-idọba-oriọna ahu waputa:

34 iko anọ emere dika ifuru osisi almond gādi kwa n’ihe-idọba-oriọna ahu, isi-ha na okoko-ha:

35 otù isi gādi kwa n’okpuru alaka abua site na ya, otù isi gādi kwa n’okpuru alaka abua site na ya, otù isi gādi kwa n’okpuru alaka abua site na ya, diri alaka isi ahu nke nēsi n’ihe-idọba-oriọna waputa.

36 Isi-ha alaka-ha gēsite na ya; ihe-idọba-oriọna ahu nile gābu otù ihe eji ọla-edo nke anāgwaghi agwa kpu.

37 I gēme kwa oriọna-ya, ha gādi asa: ha gēweli kwa oriọna-ya nile, ka ọ we nye ìhè na ncherita-iru ya.

38 Nkpa-ya nile na ihe-ikpakepu-ọku-ya nile gābu ọla-edo anāgwaghi agwa.

39 Otù talent nke ọla-edo anāgwaghi agwa ka agēji ma ya, ya na ihe ndia nile.

40 Ma le anya ka i me ha dika ihe-atù-ha si di, nke anēme ka gi onwe-gi hu n’ugwu a.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 26

1 Ebe-obibim ka i gēme kwa: were ákwà-nkwuba iri me ya; ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, nke emere ka ha yie cherubim, bú ọlu onye-ọ̀kà, ihe ndia ka i gēji me ha.

2 Ogologo nke otù ákwà-nkwuba gādi orú cubit na asatọ, obosara nke otù ákwà-nkwuba gādi kwa cubit anọ: otù ọtùtù ka ákwà-nkwuba nile gēnwe.

3 Ákwà-nkwuba ise ganējikọta onwe-ha, otù na ibe-ya; ákwà-nkwuba ise nke-ọzọ ganējikọta onwe-ha, otù na ibe-ya.

4 I gēji kwa ogho anunu me anya-nko n’elu ọnu-ọnu nke otù ákwà-nkwuba, site na nsọtu-ya nime njikọta ahu; otú a ka i gēme kwa n’ọnu-ọnu ákwà-nkwuba nke dipuru adipu nime njikọta nke-abua.

5 Ọgu anya-nko abua na iri ka i gēme n’otù ákwà-nkwuba, ọgu anya-nko abua na iri ka i gēme kwa nime nsọtu nke ákwà-nkwuba nke di na njikọta nke-abua; anya-nko gēcherita onwe-ha iru, otù na ibe-ya.

6 I gēme kwa ọgu nko ọla-edo abua na iri, were nko ahu jikọta ákwà-nkwuba, otù na ibe-ya: ebe-obibi ahu ewe buru otù.

7 I gēme kwa ákwà-nkwuba aji ewu, ibu ulo-ikwū n’elu ebe-obibi ahu: ákwà-nkwuba iri na otù ka i gēme ha.

8 Ogologo nke otù ákwà-nkwuba gādi orú cubit na iri, obosara nke otù ákwà-nkwuba gādi kwa cubit anọ: otù ọtùtù ka ákwà-nkwuba iri na otù ahu gēnwe.

9 I gējikọta kwa ákwà-nkwuba ise iche, na ákwà-nkwuba isi iche, piaji ákwà-nkwuba nke-isi n’ebe iru ulo-ikwū di.

10 I gēme kwa ọgu anya-nko abua na iri n’elu ọnu-ọnu nke otù ákwà-nkwuba ahu dipuru adipu nime njikọta ahu, me kwa ọgu anya-nko abua na iri n’elu ọnu-ọnu nke ákwà-nkwuba nke dipuru adipu nime njikọta nke abua.

11 I gēme kwa ọgu nko ọla abua na iri, me ka nko ahu ba n’anya-nko ahu, i we jikọta ulo-ikwū ahu, ọ we buru otù.

12 Ma nkwupu nke fọduru nime ákwà-nkwuba nke ulo-ikwū ahu, bú nkera ákwà-nkwuba nke fọduru, gākwupu n’azu ebe-obibi ahu.

13 Cubit ahu nke di n’otù akuku, na cubit ahu nke di n’akuku nke-ọzọ, nime nke fọduru n’ogologo nke ákwà-nkwuba nke ulo-ikwū, ọ gākwupu n’akuku abua nke ebe-obibi ahu, n’otù akuku na n’akuku nke-ọzọ, ikpuchi ya.

14 I gēme-kwa-ra ulo-ikwū ahu ihe-nkpuchi akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, ya na ihe-nkpuchi akpukpọ seal n’elu ya.

15 I gēme-kwa-ra ebe-obibi ahu ibo osisi acacia, nke nēguzo ọtọ.

16 Cubit iri ka ogologo nke otù ibo gādi, otù cubit na nkera cubit ka obosara nke otù ibo gādi kwa.

17 Otù ibo gēnwe ihe-nhiọye abua, nke ekwukọtara, otù na ibe-ya: otú a ka i gēmere ibo nile nke ebe-obibi ahu.

18 I gēme-kwa-ra ebe-obibi ahu ibo ahu, orú ibo i gēmere akuku Ndida chere iru na Ndida.

19 Ọgu ukwu ọla-ọcha abua ka i gēme kwa n’okpuru orú ibo ahu; ukwu abua n’okpuru otù ibo inara ihe-nhiọye-ya abua, ukwu abua kwa n’okpuru ibo ọzọ inara ihe-nhiọye-ya abua.

20 I gēme-kwa-ra akuku nke-abua nke ebe-obibi ahu, bú akuku Ugwu, orú ibo:

21 na ọgu ukwu ọla-ọcha ha abua; ukwu abua n’okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n’okpuru ibo ọzọ.

22 Isi ebe-obibi ahu nke chere iru n’Ọdida-anyanwu ka i gēme-kwa-ra ibo isi.

23 Ibo abua ka i gēme-kwa-ra nkuku ebe-obibi ahu n’isi-ya.

24 Ha gābu ihe abua ejikọtara n’otù n’okpuru, ha abua gābu kwa otù ihe zuru okè rue isi-ya rue otù nb͕a-aka ahu: otú a ka ọ gādiri ha abua; nkuku abua ahu ka ha gādiri.

25 Ha gādi kwa ibo asatọ, na ukwu ọla-ọcha ha, ukwu iri na isi; ukwu abua n’okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n’okpuru ibo ọzọ.

26 I gēme kwa nkpọrọ osisi acacia; ise ka i gēmere ibo otù akuku nke ebe-obibi ahu,

27 nkpọrọ ise ka i gēme-kwa-ra ibo akuku nke-ọzọ nke ebe-obibi ahu, nkpọrọ ise ka i gēme-kwa-ra ibo akuku nke ebe-obibi, bú isi-ya chere iru n’Ọdida-anyanwu.

28 Nkpọrọ etiti nke di n’etiti ibo, anēme kwa ya ka o si n’otù nsọtu gabiga rue nsọtu ọzọ.

29 I gāmachita kwa ibo nile ọla-edo, were kwa ọla-edo me nb͕a-aka-ha, ka ha buru ọnọdu itiye nkpọrọ ahu: i gāmachita kwa nkpọrọ nile ọla-edo.

30 I gēwuli kwa ebe-obibi ahu elu dika ọdidi-ya ekpere n’ikpe si di nke emeworo ka i hu ya anya n’ugwu a.

31 I gēme kwa ákwà-nb͕ochi nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma: ọ gābu ọlu onye-ọ̀kà, ọ gēme ya ka o yie cheru-bim:

32 i gētiye ya n’elu ide acacia anọ amachitara ọla-edo, nkpọye-ha gābu ọla-edo, n’elu ukwu ọla-ọcha anọ.

33 I gētiye kwa ákwà-nb͕ochi ahu n’okpuru nko ahu, i gēbubata kwa n’ebe ahu nime ákwà-nb͕ochi ahu ib͕e ihe-àmà ahu: ákwà-nb͕ochi ahu gākpa-kwa-ra unu ókè n’etiti ebe nsọ ahu na ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile.

34 I gētiye kwa ebe-nkpuchi-nmehie ahu n’elu ib͕e ihe-àmà nime ebe nsọ ahu kachasi ebe nsọ nile.

35 I gādọba table ahu n’èzí ákwà-nb͕ochi ahu, na ihe-idọba-oriọna ahu na ncherita-iru table n’akuku ebe-obibi ahu chere iru na Ndida: ma table ka i gētiye n’akuku Ugwu.

36 I gēme-kwa-ra ọnu-uzọ Ulo-ikwū ahu ákwá-nkwuchi, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma; ọ gābu ọlu onye-ọdudu-ákwà.

37 I gēme-kwa-ra ákwà-nkwuchi ahu ide acacia ise, machita ha ọla-edo; nkpọye-ha gābu ọla-edo: i gāwu-kwa-ra ha ukwu ọla ise.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 27

1 I gēme kwa ebe-ichu-àjàm ahu; ọ gābu osisi acacia, cubit ise bu ogologo-ya, cubit ise bu kwa obosara-ya; ebe-ichu-àjà ahu gēnwe akuku anọ ra nrata: cubit atọ ka idi-elu-ya gādi kwa.

2 I gēme kwa mpì-ya n’elu nkuku anọ ya: mpì-ya gēsite na ya: i gāmachita kwa ya ọla.

3 I gēme kwa ite-ya nile inara ntu-ya, na osekè-ya nile, na ọkwa-nwusa-ya nile, na ndudu-ya nile, na ihe-igu-ọku-ya nile: ọbuná ihe-ya nile ka i geji ọla me.

4 I gēme-kwa-ra ya ihe-ọkpukpa, ihe eji ub͕u ọla me; i gēme kwa nb͕a-aka ọla anọ n’elu ub͕u ọla ahu, n’elu nsọtu-ya anọ.

5 I gētiye ya n’okpuru ebe dipuru adipu buruburu ebe-ichu-àjà ahu n’okpuru, ka ub͕u ọla ahu we rue na nkera ebe-ichu-àjà ahu.

6 I gēme-kwa-ra ebe-ichu-àjà ahu nkpa-n’aka, bú nkpa-n’aka osisi acacia, machita ha ọla.

7 Agēme ka nkpa-n’aka ahu ba na nb͕a-aka ahu, nkpa-n’aka ahu gādi kwa n’elu akuku abua nke ebe-ichu-aja, mb͕e anēbu ya.

8 I gēwere ibo me ya ka ọ di ka ib͕e: dika emeworo ka i hu ya anya n’ugwu a, otú a ka ha gēme ya.

9 I gēme kwa ogige ebe-obibi ahu: akuku Ndida nke chere iru na Ndida gēnwe ákwà-ngechi igechi ogige ahu nke ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ọgu cubit ise n’ogologo gādiri otù akuku ahu:

10 ide-ya gādi orú, ukwu-ha kwa orú, ha gābu ọla; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha gābu ọla-ọcha.

11 Otú a akuku Ugwu gēnwe kwa n’ogologo-ya ákwà-ngechi ọgu cubit ise n’ogologo, ide-ya gādi orú, ukwu-ha kwa orú, ha gābu ọla; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha gābu ọla-ọcha.

12 Obo-sara ogige ahu n’akuku Ọdida-anyanwu gēnwe kwa ákwà-ngechi nke ọgu cubit abua na iri: ide-ha gādi iri, ukwu-ha iri kwa.

13 Obosara ogige ahu n’akuku Iru-anyanwu nke chere iru n’ọwuwa-anyanwu gādi ọgu cubit abua na iri.

14 Ákwà-ngechi cubit iri na ise ka otù akuku ọnu-uzọ-ama-ya gēnwe: ide-ha gādi atọ, ukwu-ha atọ kwa.

15 Akuku nke-ọzọ nke ọnu-uzọ-ama-ya gēnwe kwa ákwà-ngechi cubit iri na ise: ide-ha gādi atọ, ukwu-ha atọ kwa.

16 Ọnu-uzọ-ama nke ogige ahu gēnwe kwa ákwà-nkwuchi orú cubit, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, bú ọlu onye-ọdudu-ákwà: ide-ha gādi anọ, ukwu-ha anọ kwa.

17 Ide nile nke ogige ahu buruburu gabu ihe egegidere ngegide n’ọla-ọcha; nkpọye-ha gābu ọla-ọcha; ma ukwu-ha gābu ọla.

18 Ogologo nke ogige ahu gābu ọgu cubit ise, obosara-ya gābu ọgu abua na iri ọgu abua na iri, idi-elu-ya gābu cubit ise; ọ gābu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ma ukwu-ha gābu ọla.

19 Ihe nile nke ebe-obibi ahu n’òfùfè-ya nile, na ǹtú-ya nile, na ǹtú nile nke ogige ahu, gābu ọla.

20 Ma gi onwe-gi, i gēnye umu Israel iwu, ka ha wetara gi manu olive anāgwaghi agwa nke asuru asu, itiye n’ihe nēnye ìhè, iweli oriọna mb͕e dum.

21 N’ulo-ikwū nzute, bú n’èzí ákwà-nb͕ochi nke di n’akuku ihe-àmà, ka Eron na umu-ya ndikom gēdo ya n’usoro site n’anyasi rue ututu n’iru Jehova: ọ gābu ukpuru mb͕e ebighi-ebi rue ọb͕ọ-ha nile site n’umu Israel.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 28

1 Ma gi onwe-gi, me ka Eron, bú nwa-nne-gi, ya na umu-ya ndikom, si n’etiti umu Israel biakute gi nso, ka ọ we burum onye-nchu-aja, bú Eron, ya na Nedab na Abaihu, na Eleeza na Itama, bú umu-ndikom Eron.

2 I gēme-kwa-ra Eron, bú nwa-nne-gi, uwe nsọ, ibu ihe-nsọpuru na ihe mara nma.

3 Gi onwe-gi gāgwa kwa ndi nile nwere obi amam-ihe, bú ndi M’mejuworo na mọ amam-ihe, ka ha me uwe Eron ido ya nsọ, ka o we burum onye-nchu-aja.

4 Ndia bu uwe ha gēme; ihe-ib͕ochi-obi, na ephod, na uwe-nwuda, na uwe-ime turu agwa, na nkechi isi, na ihe ike n’úkwù: ha gēme-kwa-ra Eron, bú nwa-nne-gi, na umu-ya ndikom, uwe nsọ, ka ọ we burum onye-nchu-àjà.

5 Ndi ahu gēwere kwa ọla-edo ahu, na ogho anunu ahu, na ogho ododo ahu, na ogho uhie ahu, na ezi ákwà ọcha ahu.

6 Ha gēme kwa ephod ahu; ọ gābu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, bú ọlu onye-ọ̀kà.

7 Ọ gēnwe kwa ubu abua ejikọtara na nsọtu-ya abua; ka ewe jikọta ya n’otù.

8 Ihe-ọkiké nke onye-ọ̀kà kpara, nke di n’elu ya, nke eji ke ya, ọ gādi ka ọlu aluru ya si di, o gēsite kwa na ya; ọ gābu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma.

9 I gēwere kwa nkume onyx abua, b͕unye aha umu Israel n’elu ha:

10 itinye aha ha n’elu otù nkume, aha nke umu Israel isī nke fọduru n’elu nkume nke-ọzọ, dika ọmumu nile ha si di.

11 Ọlu nke onye-ọ̀kà na nkume ka a gēji b͕u eb͕ub͕u nkume abua ahu, dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, dika aha umu Israel si di: i gēme ka ihe ọla-edo akpara akpà b͕a ha buruburu.

12 I gētiye kwa nkume abua ahu n’elu ubu ephod, iburu umu Israel nkume ncheta: Eron gēbu kwa aha-ha n’iru Jehova n’elu ubu-ya abua, ibu ihe-ncheta.

13 I gēme kwa ihe ọla-edo akpara akpà:

14 na iyab͕a abua nke ọla-edo anāgwaghi agwa; dika eriri-nma ka i gēme ha, ihe emere dika udọ̀ aturu atu; i gētiye kwa iyab͕a ahu aturu atu dika udọ̀ n’elu ihe ọla-edo ahu akpara akpà.

15 I gēme kwa ihe-ib͕ochi-obi nke ikpé, ọ gābu ọlu nke onye-ọ̀kà; dika ọlu aluru n’ephod ahu ka i gēme ya; ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ndia ka i gēji me ya.

16 Ihe nwere akuku anọ ra nrata ka ọ gābu, ihe apiajiri apiaji, ntù-aka ka ogologo-ya gādi, ntù-aka ka obosara-ya gādi kwa.

17 I gāhiọgide kwa nime ya nhiọgide nkume, eriri nkume anọ: eriri sardius na topaz na carbuncle gābu eriri mbu;

18 eriri nke-abua gābu emerald na sapphire na diamond;

19 eriri nke-atọ gābu jacinth na agate na amethyst:

20 eriri nke-anọ gābu beryl na onyx na jasper: agētiye ha n’ọla-edo akpara akpà n’ebe-nhiọgide-ha.

21 Nkume ahu gādi ka aha umu Israel si di, iri na abua, dika aha-ha si di; dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, onye ọ bula dika aha-ya si di, ha gādiri ebo iri na abua ahu.

22 I gēme kwa n’elu ihe-ib͕ochi-obi ahu iyab͕a emere dika eriri-nma, bú ihe emere dika udọ̀ aturu atu; ha gābu ọla-edo anāgwaghi agwa.

23 I gēme kwa n’elu ihe-ib͕ochi-obi ahu nb͕a-aka ọla-edo abua, tiye nb͕a-aka abua ahu n’elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi.

24 I gētiye kwa iyab͕a ọla-edo abua ahu aturu atu dika udọ̀ n’elu nb͕a-aka abua ahu di na nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi ahu.

25 Nsọtu abua ọzọ nke iyab͕a abua ahu aturu atu dika udọ̀, i gētiye ha n’elu ihe ọla-edo abua ahu akpara akpà, tiye ha n’elu ubu ephod ahu n’ebe iru-ya di.

26 I gēme kwa nb͕a-aka ọla-edo abua, tukwasi ha n’elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi ahu, n’ọnu-ọnu-ya, nke chere iru n’akuku ephod ahu nime.

27 I gēme kwa nb͕a-aka ọla-edo abua, tiye ha n’elu ubu abua nke ephod n’okpuru, n’ebe iru-ya di, na nso njikọta-ya, n’elu ihe-ọkiké ephod nke onye-ọ̀kà kpara.

28 Ha gēwere kwa eriri-nma ogho anunu ke ihe-ib͕ochi-obi ahu na nb͕a-aka ephod site na nb͕a-aka-ya, ka ọ we di n’elu ihe-ọkiké ephod ahu nke onye-ọ̀kà kpara, ya na ka ewe ghara isi n’ephod tọpu ihe-ib͕ochi-obi ahu.

29 Eron gēbu kwa aha umu Israel n’ihe-ib͕ochi-obi nke ikpé n’elu obi-ya, mb͕e ọ nābà n’ebe nsọ ahu, ibu ihe-ncheta n’iru Jehova mb͕e dum.

30 I gētiye kwa n’ihe-ib͕ochi-obi nke ikpé ahu Ìhè ahu na Izu-okè ahu; ha gādi kwa n’elu obi Eron mb͕e ọ nābà nime n’iru Jehova: Eron gēbu kwa ikpé nke umu Israel n’elu obi-ya n’iru Jehova mb͕e dum.

31 I gēme kwa uwe-nwuda ephod, ọ gābusi ogho anunu ogho anunu.

32 Ọnu nke isi-ya gādi n’etiti ya: ọnu-ọnu, bú ọlu ọkpa-ákwà, ka ọnu-ya gēnwe buru-buru, dika ọnu nke uwe-obi agha ka ọ gēnwe, ka ewe ghara idọwa ya.

33 I gēme kwa n’ọnu-ọnu-ala-ya pomegranate nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, n’ọnu-ọnu-ala-ya buru-buru; i gēme kwa ataṅu ọla-edo n’etiti ha buruburu.

34 Otù ataṅu ọla-edo na otù pomegranate, otù ataṅu ọla-edo na otù pomegranate, gādi n’ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu buruburu.

35 Ọ gādi kwa n’aru Eron iji je ozi: aganānu kwa olu-ya mb͕e ọ nābà n’ebe nsọ n’iru Jehova, ya na mb͕e ọ nāputa, ka ọ we ghara inwu.

36 I gēme kwa ihe di mbara nke ọla-edo anāgwaghi agwa, i gēb͕u kwa n’elu ya, dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, IHE NSỌ JEHOVA NWERE.

37 I gātukwasi ya n’eriri-nma ogho anunu, ọ gādikwasi n’ákwà-nkukù-isi ahu; n’iru ákwà-nkukù-isi ka ọ gādi.

38 Ọ gādi kwa n’egedege-iru Eron, Eron gēbu kwa ajọ omume nke ihe nsọ nile, nke umu Israel gēdo nsọ n’onyinye nsọ ha nile; ọ gādi n’egedege-iru-ya mb͕e dum, ka ha we buru ihe nātọ utọ n’iru Jehova.

39 I gātu-kwa-ra uwe-ime-ya nke ezi ákwà ọcha agwa, i gēme kwa akwa nkechi nke ezi ákwà ọcha, i gēme kwa ihe ike n’úkwù, ọ gābu ọlu nke onye-ọdudu-ákwà.

40 Umu-ndikom Eron ka i geme-kwa-ra uwe-ime, me-kwa-ra ha ihe ike n’úkwù, ihe ike n’isi ka i gēme-kwa-ra ha, ibu ihe-nsọpuru na ihe mara nma.

41 I gēyi-kwasi ha n’aru Eron, bú nwa-nne-gi, na n’aru umu-ya ndikom tiyere ya; i gēte kwa ha manu, meju aka-ha, do ha nsọ, ka ha we burum ndi-nchu-àjà.

42 Gi me-kwa-ra ha uwe-úkwú ákwà ọcha ikpuchi anu-aru ọtọ-ha; site n’úkwù we rue apata-ukwu ka ha gādi:

43 ha gādi n’aru Eron na n’aru umu-ya ndikom, mb͕e ha nābà n’ulo-ikwū nzute, ma-ọbu mb͕e ha nābiaru nso ebe-ichu-àjà ahu ije ozi n’ebe nsọ ahu, ka ha we ghara iburu ajọ omume, we nwua: ukpuru mb͕e ebighi-ebi ka ọ gāburu ya, buru kwa nkpuru-ya gānọchi ya.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 29

1 Nka bu kwa ihe i gēme ha ido ha nsọ, ka ha we burum ndi-nchu-àjà: were otù nwa-oke-ehi na ebulu abua nke zuru okè,

2 na achicha ekoghieko, na ob͕e achicha ufọdu ekoghieko nke agwara manu, na mbadamba-achicha ufọdu ekoghi-eko nke etere manu: utu flour nke ọka wheat ka i gēwere me ha.

3 I gētiye ha n’otù nkata, bute ha nso nime nkata ahu, ha na oke-ehi ahu na ebulu abua ahu.

4 Eron na umu-ya ndikom ka i gēme kwa ka ha biarue nso ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute, i gēwere miri sa ha aru.

5 I gāchiri kwa uwe ahu, yikwasi Eron uwe-ime, na uwe-nwuda ephod, na ephod, na ihe-ib͕ochi-obi, were kwa ihe-ọkiké nke ephod nke onye-ọ̀kà kpara ke ya:

6 i gēkpukwasi kwa akwa nkechi ahu n’isi-ya, tiye okpu nsọ nke onye-nchu-àjà n’elu ákwà-nkukù-isi ahu.

7 I gēwere kwa manu otite-manu ahu wukwasi n’isi-ya, we te ya.

8 Umu-ya ndikom ka i gēme kwa ka ha biarue nso, i gēyikwasi ha uwe-ime.

9 I gēwere kwa ihe ike n’úkwù ke ha, bú Eron na umu-ya ndikom, i gēke kwa ha ihe ike n’isi: ha gēnwe kwa ọlu nchu-àjà site n’ukpuru ebighi-ebi: i gēmeju kwa aka Eron na aka umu-ya ndikom.

10 I gākputa kwa oke-ehi ahu nso n’iru ulo-ikwū nzute: Eron na umu-ya ndikom gēbikwasi aka-ha n’isi oke-ehi ahu.

11 I gēb͕u kwa oke-ehi ahu n’iru Jehova, n’ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.

12 I gēwere ufọdu nime ọbara oke-ehi ahu, tiye n’elu mpì nile nke ebe-ichu-àjà na nkpisi-aka-gi: ọ bu kwa ọbara nile ka i gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà.

13 I gēwere kwa abuba nile nke nēkpuchi ihe-ime, na mba-imeju nke di n’imeju, na akọrọ abua, na abuba nke di n’elu ha, sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’elu ebe-ichu-àjà.

14 Ma anu oke-ehi ahu, na akpukpọ-ya, na nsi-ya, i gēsure ya n’ọku n’azu ọmuma-ulo-ikwū-unu: àjà-nmehie ka ọ bu.

15 Otù nime ebulu abua ahu ka i gēwere kwa; Eron na umu-ya ndikom gēbikwasi aka-ha n’isi ebulu ahu.

16 I gēb͕u ebulu ahu, were ọbara-ya, wusa n’ebe-ichu-àjà ahu buruburu.

17 I gābọ kwa ebulu ahu n’ọbubọ-ya, sa ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya, tiye ha n’elu ọbubọ-ya, na n’elu isi-ya.

18 I gēsure kwa ebulu ahu nile ọku ibu ihe nēsì ísì utọ n’elu ebe-ichu-àjà: àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova ka ọ bu: ihe ísì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova, ka ọ bu.

19 I gēwere kwa ebulu nke-ọzọ; Eron na umu-ya ndikom gēbikwasi kwa aka-ha n’isi ebulu ahu.

20 I gēb͕u kwa ebulu ahu, were ufọdu nime ọbara-ya, tiye n’ọnu-ọnu nti aka-nri Eron, na n’ọnu-ọnu nti aka-nri umu-ya ndikom, na n’isi-aka nke aka-nri-ha, na n’isi-ukwu nke ukwu aka-nri ha, wusa kwa ọbara-ya n’ebe-ichu-àjà ahu buruburu.

21 I gēwere kwa ufọdu nime ọbara nke di n’elu ebe-ichu-àjà, na ufọdu nime manu nke otite-manu ahu, fesa n’aru Eron, na n’elu uwe-ya, na n’aru umu-ya ndikom, na n’elu uwe umu-ya ndikom tiyere ya: ọ gādi kwa nsọ, ya onwe-ya, na uwe-ya, na umu-ya ndikom, na uwe umu-ya ndikom tiyere ya.

22 I gēsi kwa n’ebulu ahu were abuba-ya, na akuku ọdudu-ya nwere abuba, na abuba nke nēkpuchi ihe-ime-ya, na mba-imeju nke imeju, na akọrọ-ya abua, na abuba nke di n’elu ha, na utaku-ukwu aka-nri-ya; n’ihi na ebulu nke nmeju-aka ka ọ bu:

23 na otù ob͕e achicha, na otù ob͕e achicha agwara manu, na otù mbadamba-achicha, site na nkata achicha ekoghi-eko ahu nke di n’iru Jehova:

24 i gātukwasi ha nile n’ọbu-aka abua nke Eron, na n’ọbu-aka nke umu-ya ndikom, fé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé n’iru Jehova.

25 I gānara kwa ha n’aka-ha, sure ha ọku ibu ihe nēsì ísì utọ n’elu ebe-ichu-àjà n’elu àjà-nsure-ọku ahu, ka ha buru ihe ísì utọ n’iru Jehova: àjà-ọku anāchuru Jehova ka ọ bu.

26 I gēsi kwa n’ebulu nke nmeju-aka nke diri Eron were okpukpu-obi-ya, fé ya ka ọ buru àjà-ofufé n’iru Jehova: ọ gābu kwa òkè i nwere.

27 I gēdo kwa okpukpu-obi nke àjà-ofufé nsọ, ya na utaku-ukwu nke àjà-nbuli, nke anēfé, na nke anēbuli, site n’ebulu nke nmeju-aka ahu, bú site na nke diri Eron, site kwa na nke diri umu-ya ndikom:

28 ọ gābu kwa ihe Eron na umu-ya ndikom gēnwe dika ukpuru mb͕e ebighi-ebi sitere n’aka umu Israel: n’ihi na àjà-nbuli ka ọ bu: àjà-nbuli ka ọ gābu kwa sitere n’aka umu Israel, site n’ihe àjà nile nke àjà-udo-ha, bú àjà-nbuli-ha anēbuliri Jehova.

29 Uwe nsọ Eron nwere gādiri umu-ya ndikom ndi gānọchi ya, ka ewe te ha manu nime ha, meju kwa aka-ha nime ha.

30 Ubọchi asa ka o gēyiri ha, bú onye-nchu-àjà ahu nke gānọchi ya site n’umu-ya ndikom, mb͕e ọ nābà n’ulo-ikwū nzute ije ozi n’ebe nsọ ahu.

31 Ma ebulu nke nmeju-aka ahu, i gēwere ya sie anu-ya n’ebe di nsọ.

32 Eron na umu-ya ndikom gēri kwa anu ebulu ahu, na achicha nke di na nkata ahu, n’ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.

33 Ha gēri kwa ha, bú ihe eji kpuchi nmehie, imeju aka-ha na ido ha nsọ: ma onye ala ọzọ agaghi-eri ha, n’ihi na nsọ ka ha di.

34 Ma ọ buru na ihe afọdu site n’anu nke nmeju-aka ahu, ma-ọbu site n’achicha, rue ututu, i gēsure kwa ihe fọduru n’ọku: agaghi-eri ya, n’ihi na nsọ ka ọ di.

35 I gēme kwa Eron, me kwa umu-ya ndikom, otú a, dika ihe nile si di nke M’nyeworo gi n’iwu: ubọchi asa ka i gēmeju aka-ha.

36 Oke-ehi nke àjà-nmehie ka i gāchu kwa bayere nkpuchi-nmehie kwa-ubọchi: i gēwepu kwa nmehie n’ebe-ichu-àjà ahu mb͕e i nēkpuchi nmehie n’elu ya; i gēte kwa ya manu, ido ya nsọ.

37 Ubọchi asa ka i gēkpuchi nmehie n’elu ebe-ichu-àjà ahu, we do ya nsọ: ebe-ichu-àjà ahu gābu kwa ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile: ihe ọ bula nke nēmetu ebe-ichu-àjà ahu aru gādi nsọ.

38 Ma nka bu ihe i gāchu n’elu ebe-ichu-àjà ahu; umu-aturu abua, nke b͕ara otù arọ, kwa-ubọchi mb͕e dum.

39 Otù nime umu-aturu ahu ka i gāchu n’ututu; chu kwa nwa-aturu nke-ọzọ n’etiti ehihie na anyasi:

40 otù uzọ n’uzọ iri nke otù ephad utu oka flour agwara n’otù uzọ n’uzọ anọ nke otù hin nke manu asuru asu gādiri otù nwa-aturu ahu; ya na otù uzọ n’uzọ anọ nke otù hin nke manya-vine, ka ọ buru àjà-ihe-ọṅuṅu.

41 Nwa-aturu nke-ọzọ ka i gāchu kwa n’etiti ehihie na anyasi; dika onyinye-inata-iru-ọma enyere n’ututu, na dika àjà-ihe-ọṅuṅu-ya, otú a ka i gēme ya, ka ọ buru ihe ísì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova.

42 Ọ gābu àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum rue ọb͕ọ-unu nile n’ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute n’iru Jehova: ebe M’gēzute unu, igwa gi okwu n’ebe ahu.

43 M’gēzute kwa umu Israel n’ebe ahu; anēji kwa ebubem do Ulo-ikwū ahu nsọ.

44 M’gēdo kwa ulo-ikwū nzute nsọ, ya na ebe-ichu-àjà ahu: Eron na umu-ya ndikom ka M’gēdo kwa nsọ, iburum ndi-nchu-àjà.

45 M’gēbi kwa n’etiti umu Israel, M’gābu-kwa-ra ha Chineke.

46 Ha gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova Chineke-ha, Nke mere ka ha si n’ala Ijipt puta, ka M’we biri n’etiti ha: Mu onwem bu Jehova Chineke-ha.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 30

1 I gēme kwa ebe-ichu-àjà isure ihe-nsure-oku nēsì ísì utọ: osisi acacia ka i gēji me ya.

2 Otù cubit ka ogologo-ya gādi, otù cubit ka obosara-ya gādi kwa; ihe nwere akuku anọ ra nrata ka ọ gābu: cubit abua ka idi-elu-ya gādi kwa: mpì-ya nile gēsite na ya.

3 I gāmachita ya ọla-edo anāgwaghi agwa, elu-ya, na akuku-ya nile buruburu, na mpì-ya nile; i gēme-kwa-ra ya mpempe ọla-edo buruburu.

4 Nb͕a-aka ọla-edo abua ka i gēme-kwa-ra ya n’okpuru mpempe-ya, n’elu ihe-akuku-ya abua, i gēme ha n’elu akuku-ya abua; ha gābu kwa ọnọdu inara nkpa-n’aka eji ebu ya.

5 I gēji kwa osisi acacia me nkpa-n’aka ahu, i gāmachita kwa ha ọla-edo.

6 I gētiye ya n’iru ákwà-nb͕ochi nke di n’akuku ib͕e ihe-àmà, n’iru ebe-nkpuchi-nmehie nke di n’elu ihe-àmà ahu, ebe M’gēzute gi.

7 Eron gēsure kwa n’elu ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me: kwa-ututu, mb͕e ọ nēdozi oriọna, ka ọ gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

8 Mb͕e Eron nēweli oriọna n’etiti ehihie na anyasi ka ọ gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ọ bu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ anēsure n’iru Jehova mb͕e dum rue ọb͕ọ-unu nile.

9 Unu ewerela ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nke ala ọzọ, ma-ọbu àjà-nsure-ọku, ma-ọbu onyinye-inata-iru-ọma, sure dika àjà n’elu ya; unu awusi-kwa-la àjà-ihe-ọṅuṅu n’elu ya.

10 Eron gēkpuchi kwa nmehie n’elu mpì-ya otù ub͕ò n’arọ: site n’ọbara àjà-nmehie nke nkpuchi-nmehie ka o gēkpuchi nmehie n’elu-ya otù ub͕ò n’arọ rue ọb͕ọ-unu nile: ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile ka ọ buru Jehova.

11 Jehova we gwa Moses okwu, si,

12 Mb͕e i nāguta ọnu-ọgugu umu Israel, dika ndi anāgukọta agukọta n’etiti ha si di, ha nile n’otù n’otù gēnye kwa Jehova ihe-nb͕aputa bayere nkpuru-obi-ha, mb͕e i nāgukọta ha; ka ihe-otiti we ghara idi n’etiti ha mb͕e i nāgukọta ha.

13 Ihe a ka ha gēnye, onye ọ bula nke nāgabiga n’ebe ndi agukọtaworo nọ, nkera shekel dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: (shekel bu orú gerah:) nkera shekel ahu bu àjà-nbuli anēbuliri Jehova.

14 Onye ọ bula nke nāgabiga n’ebe ndi agukọtaworo nọ, site n’onye b͕ara orú arọ we gaba n’iru, ọ gēnye àjà-nbuli nke Jehova.

15 Ọgaranya agaghi-enye kari, ma ob͕eye agaghi-enyebì kari, nkera shekel ahu, mb͕e ha nēnye àjà-nbuli nke Jehova, ikpuchiri nkpuru-obi-unu nmehie.

16 I gānara kwa ego nkpuchi-nmehie ahu n’aka umu Israel, nye ya n’òfùfè nke ulo-ikwū nzute; ka ọ we buru umu Israel ihe-ncheta n’iru Jehova, ikpuchiri nkpuru-obi-unu nmehie.

17 Jehova we gwa Moses okwu, si,

18 I gēme kwa ite ọsisa-miri, ọ gābu ọla, ukwu-ala-ya gābu kwa ọla, iji sa aru: i gētiye ya n’etiti ulo-ikwū nzute na ebe-ichu-àjà, tiye miri n’ebe ahu.

19 Eron na umu-ya ndikom gāsa aka-ha na ukwu-ha site na ya:

20 mb͕e ha nābà n’ulo-ikwū nzute, ha gāsa miri, ka ha we ghara inwu; ma-ọbu mb͕e ha nābiaru ebe-ichu-àjà nso ije ozi, isurere Jehova àjà-ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ:

21 ha gāsa kwa aka-ha na ukwu-ha, ka ha we ghara inwu: ọ gābu-kwa-ra ha ukpuru mb͕e ebighi-ebi, bú ya na nkpuru-ya rue ọb͕ọ-ha nile.

22 Jehova we gwa Moses okwu, si,

23 Gi onwe-gi kwa, chiri n’onwe-gi uda nile kachasi nma, myrrh nke nērù erù, nnù shekel na ọgu ise, na uda-cinnamon, nkera-ya, bú ọgu shekel iri na ọgu abua na iri, na uda-calamus, ọgu shekel iri na ọgu abua na iri,

24 na cassia, nnù shekel na ọgu ise, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di, na manu olive, otù hin:

25 i gēme ya ka ọ buru manu otite-manu di nsọ, manu-otite nēsì ísì utọ asugwara asugwa, bú ọlu nke onye nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ: manu otite-manu di nsọ ka ọ gābu.

26 I gēwere ya te ulo-ikwū nzute, na ib͕e ihe-àmà ahu,

27 na table ahu na ihe-ya nile, na ihe-idọba-oriọna na ihe-ya nile, na ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ,

28 na ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu na ukwu-ala-ya.

29 I gēdo kwa ha nsọ, ka ha we buru ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile: ihe ọ bula nēmetu ha aru gādi nsọ.

30 Eron na umu-ya ndikom ka i gēte kwa manu, we do ha nsọ, iburum ndi-nchu-àjà.

31 I gāgwa kwa umu Israel okwu, si, Manu otite-manu di nsọ ka nka gāburum rue ọb͕ọ-unu nile.

32 Ọ bughi n’anu-aru madu ka agāwukwasi ya, unu eme-kwa-la nke di ka ya n’ọtùtù-ya: nsọ ka ọ di, nsọ ka ọ gādiri unu.

33 Onye ọ bula nke gāsugwa nke di ka ya, ma-ọbu onye ọ bula nke gēwere ufọdu nime ya tiye n’aru onye ala ọzọ, agēbipu ya n’etiti umu-nna-ya.

34 Jehova we si Moses, Chiri n’onwe-gi uda utọ di iche iche, stacte, na onycha, na galbanum; bú uda utọ, ha na frankincense anāgwaghi agwa: ha gāra n’ọtùtù;

35 i gēme ya ka ọ buru ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, manu-otite nēsì ísì utọ asugwara asugwa, bú ọlu onye nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ, nke etiyere nnú, nke anāgwaghi agwa, di kwa nsọ:

36 i gēsu kwa ufọdu nime ya ka ọ di irighiri, were ufọdu nime ya tiye n’iru ihe-àmà ahu n’ulo-ikwū nzute, ebe M’gēzute gi; ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ gāburu unu.

37 Ma ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nke i gēme, unu emerela onwe-unu nke di ka ya n’ọtùtù-ya: nsọ ka ọ gādiri gi n’ebe Jehova nọ.

38 Onye ọ bula nke gēme nke di ka ya, inu ísì-ya, agēbipu kwa ya n’etiti umu-nna-ya.