Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 11

1 Jehova we si Moses, Otù ihe-otiti fọduru M’gēme ka ọ bia n’aru Fero na n’aru ndi Ijipt; emesia o gēsi n’ebe a zipu unu: mb͕e ọ nēzipuzu unu nile, ọ ghaghi ichupu unu n’ebe a.

2 Biko, kwue na nti ndim, ka ha riọ kwa, nwoke ọ bula n’aka nwoke-ibe-ya na nwayi ọ bula n’aka nwayi-ibe-ya, ihe ọla-ọcha na ihe ọla-edo.

3 Jehova we nye ndi Israel amara n’iru ndi Ijipt. Ọzọ, nwoke ahu, bú Moses, di uku ri nne n’ala Ijipt, n’anya ndi-orù Fero, na n’anya ndi ahu.

4 Moses we si, Otú a ka Jehova siri, Dika n’etiti abali Mu onwem ganāpu je n’etiti Ijipt:

5 umu nile eburu uzọ mu n’ala Ijipt gānwu kwa, site na nwa eburu uzọ muru Fero nke n-anọkwasi n’oche-eze-ya, we rue nwa o buru uzọ mu, bú nwayi nēje ozi nke nọ n’azu nkume-igwe-nri; na umu nile anumanu buru uzọ mu.

6 Oké iti-nkpu gādi kwa n’ala Ijipt nile, nke iti-nkpu dika ya akādighi, iti-nkpu dika ya agaghi-adi kwa ọzọ.

7 Ma imegide umu Israel nile nkita agaghi-araghari ire-ya, imegide madu ma-ọbu anumanu: ka unu we mara na Jehova nākpa ókè n’etiti ndi Ijipt na Israel.

8 Ndi-orù-gi ndia nile gārida-kutem, kpọ isi ala nyem, si, Pua, gi onwe-gi, na ndi nile nke nọ n’ukwu-gi: emesia m’gāpu. Ọ we si n’ebe Fero nọ pua n’iwe di ọku.

9 Jehova we si Moses, Fero agaghi-ege unu nti: ka ihe-ebubem we di ọtutu n’ala Ijipt.

10 Moses na Eron we me ihe-ebube ndia nile n’iru Fero: ma Jehova mere ka obi Fero di ike, o zipughi kwa umu Israel n’ala-ya.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 12

1 Jehova we gwa Moses na Eron okwu n’ala Ijipt, si,

2 Ọnwa nka gāburu unu isi ọnwa nile: ọnwa mbu nime ọnwa nile nke arọ ka ọ gāburu unu.

3 Gwanu nzukọ nile nke Israel okwu, si, N’ubọchi nke-iri nke ọnwa nka ka ha gēwere n’onwe-ha, onye ọ bula o were nwa-aturu, dika ulo nna-unu-hà si di, ka otù nwa-aturu diri otù ulo:

4 ma ọ buru na ulo ahu dikari ntà iri nwa-aturu, ya onwe-ya na onye-ab͕ata-obi-ya nke bi nso ulo-ya gēwere kwa otù dika ọnu-ọgugu madu si di; onye ọ bula dika oriri-ya si di, otú a ka unu gāguru nwa-aturu ahu ọgugu.

5 Nwa-aturu unu nwere gābu nke zuru okè, oké nke b͕ara otù arọ: n’etiti aturu ma-ọbu n’etiti ewu ka unu gēsi weputa ya:

6 ọ gābu-kwa-ra unu ihe-ndebe rue ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa nka: nkpọkọta nile nke nzukọ Israel gēb͕u ya n’etiti ehihie na anyasi.

7 Ha gēwere ufọdu nime ọbara-ya, tiyekwasi ya n’awara-uzọ abua na n’ọfiere-uzọ n’ulo nile nke ha gēri ya nime ha.

8 Ha gēri anu-aru-ya n’abali ahu, aruru n’ọku, ya na achicha ekoghi-eko; tiyere ihe di iche iche nēlu ilu ka ha gēri ya.

9 Unu erila ihe nime ya na ndu, ma-ọbu isi ya na miri ma-ọli, kama aruru n’ọkui; isi-ya tiyere ọlu-ukwu-ya na ọlu-aka-ya, tiye-kwa-ra ihe-ime-ya.

10 Unu agaghi-eme ka ihe ọ bula fọdu site na ya rue ututu; ma ihe fọduru site na ya rue ututu, n’ọku ka unu gēsure ya.

11 Otú a ka unu gēri ya; n’iji ihe-ọkiké ke n’úkwù-unu, na akpukpọ-ukwú-unu n’ukwù, na nkpa-n’aka-unu n’aka-unu: unu gēri kwa ya na ngwa: ngabiga nke diri Jehova ka ọ bu.

12 M’gāgabiga kwa n’ala Ijipt n’abali ahu, tib͕u nwa ọ bula eburu uzọ mu n’ala Ijipt, ma madu ma anumanu; ọ bu kwa n’aru chi nile nke Ijipt ka M’gēme ihe nile ekpere n’ikpe: Mu onwem bu Jehova.

13 Ọbara ahu gāburu unu ihe-iriba-ama n’aru ulo nile ebe unu onwe-unu nọ: mb͕e M’huru ọbara ahu, M’gāgabiga unu, ọ dighi kwa ihe-otiti gādi n’aru unu ibu ihe-nbibì, mb͕e M’nētib͕u ndi bi n’ala Ijipt.

14 Ubọchi a gāburu unu ihe-ncheta, unu gēme kwa ya ka ọ buru ememe unu nēmere Jehova: n’ọb͕ọ nile unu ka unu ganēme ya ka ọ buru ememe site n’ukpuru ebighi-ebi.

15 Ubọchi asa ka unu gēri achicha ekoghi-eko; ọ buná n’ubọchi mbu ka unu gēme ka ihe nēko achicha ghara idi n’ulo nile unu: n’ihi na onye ọ bula nke nēri achicha koro eko site n’ubọchi mbu rue ubọchi nke-asa, agēbipu madu ahu n’Israel.

16 N’ubọchi mbu nkpọkọta di nsọ gādi, n’ubọchi nke-asa nkpọkọta di nsọ gādi-kwa-ra unu; ọ dighi ozi ọ bula agēje nime ha, nání ihe onye ọ bula gēri, nání nke ahu ka unu gēme.

17 Unu gēdebe kwa ememe achicha ekoghi-eko; n’ihi na ọ bu nime otù ubọchi a ka M’meworo ka usu nile nke ndi-agha-unu si n’ala Ijipt puta: unu gēdebe kwa ubọchi a rue ọb͕ọ nile unu site n’ukpuru ebighi-ebi.

18 N’onwa mbu, n’ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n’anyasi, ka unu gēri achicha ekoghi-eko, rue ubọchi nke-orú-na-otù nke ọnwa ahu n’anyasi.

19 Ubọchi asa ka anāgaghi-ahu ihe nēko achicha n’ulo nile unu: n’ihi na onye ọ bula nke nēri achicha koro eko, agēbipu madu ahu nime nzukọ Israel, ma n’etiti ndi-ọbìa, ma n’etiti ndi amuru n’ala.

20 Unu agaghi-eri achicha ọ bula koro eko; n’ebe-obibi-unu nile ka unu gēri achicha ekoghi-eko.

21 Moses we kpọ ndi-okenye nile nke Israel, si ha, Kpuputanu, chiri kwa ìgwè ewu na aturu n’onwe-unu, dika ab͕uru-unu nile si di, b͕u-kwa-nu anu ngabiga nka.

22 Unu gēwere kwa ùkwù hyssop, sue ya n’ọbara nke di n’ọkwa, were ya jua ọbara ufọdu nke di n’ọkwa elu-uzọ na n’awara-uzọ abua; unu onwe-unu agaghi-apu kwa, onye ọ bula n’ọnu-uzọ ulo-ya, rue ututu.

23 N’ihi na Jehova gāgabiga iti ndi Ijipt ihe; ma mb͕e Ọ huru ọbara ahu n’elu elu-uzọ na n’elu awara-uzọ abua, Jehova gāgabiga ọnu-uzọ ahu, Ọ gaghi-ekwe onye-nbibì ahu ka ọ ba n’ulo-unu iti unu ihe.

24 Unu gēdebe kwa ihe a ka ọ buru ukpuru n’ebe i nọ na n’ebe umu-gi nọ rue mb͕e ebighi-ebi.

25 O gēru kwa, mb͕e unu gābà n’ala ahu nke Jehova gēnye unu, dika O kwuworo, na unu gēdebe òfùfè a.

26 O gēru kwa, mb͕e umu-unu gāsi unu, Gini bu òfùfè a unu nwere?

27 na unu gāsi, Àjà ngabiga ka ọ bu nke anāchuru Jehova, Onye gabigara ulo nile nke umu Israel n’Ijipt, mb͕e O tiri ndi Ijipt ihe, O we naputa ulo nile ayi. Ndi Israel we rube isi, kpọ isi ala.

28 Umu Israel we je me ya; dika Jehova nyere Moses na Eron iwu, otú a ka ha mere.

29 O rue, n’etiti abali, na Jehova tib͕uru nwa ọ bula eburu uzọ mu n’ala Ijipt, site na nwa eburu uzọ muru Fero nke nānọkwasi n’oche-eze-ya rue nwa eburu uzọ muru onye adọtara n’agha nke nọ n’ulo olùlù; O tib͕u-kwa-ra nwa anumanu ọ bula eburu uzọ mu.

30 Fero we bilie n’abali, ya onwe-ya, na ndi-orù-ya nile, na ndi Ijipt nile; oké iti-nkpu we di n’Ijipt; n’ihi na ọ dighi ulo ebe onye nwuru anwu nādighi.

31 O we kpọ Moses na Eron n’abali, si, Bilienu, si n’etiti ndim pua, ma unu onwe-unu ma umu Israel; je-kwa-nu, fè Jehova, dika unu kwuru.

32 Chirinu ma ìgwè ewu na aturu-unu ma ìgwè ehi-unu, dika unu kwuru, jenu; gọzi-kwa-num.

33 Ndi Iiipt we di ike n’aru ndi Israel izipu ha n’ala-ha ngwa ngwa; n’ihi na ha siri, Ayi nile bu ndi nwuru anwu.

34 Ndi Israel we buru utu ọka flour-ha agwọrọ agwọ tutu o ko, ebe ekere ihe-ha eji agwọ achicha n’uwe-nb͕okwasi-ha tukwasi n’ubu-ha.

35 Umu Israel me-kwa-ra dika okwu Moses si di; ha we riọ n’aka ndi Ijipt ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe-nb͕okwasi:

36 Jehova we nye ndi Israel amara n’iru ndi Ijipt, ha we me ka ha riọta ihe. Ha we napu ndi Ijipt ihe-ha.

37 Umu Israel we bulie ije site na Rameses rue Sukot, ihe ra ka orú nnù ndikom ọgu uzọ atọ na orú nnù uzọ iri-na-ise, ndi ji ukwu eje, bú ndikom, nāgughi umu-ntakiri.

38 Ọzọ kwa, ọtutu ndi gwara ọgwa soro ha rigo; na ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, anu-ulo riri nne nke-uku.

39 Ha we were utu ọka flour agwọrọ agwọ, bú nke ha si n’Ijipt bute, sie achicha ekoghi-eko, n’ihi na o koghi eko; n’ihi na achupuru ha n’Ijipt, ha apughi kwa inọ ọdù, ọzọ kwa, ọ dighi ihe iri n’uzọ ha doziri onwe-ha.

40 Ma obibi umu Israel, nke ha biri n’Ijipt, di nnù arọ na orú arọ na iri.

41 O rue, n’ọgwugwu nnù arọ na orú arọ na iri ahu, ọ bu kwa n’otù ubọchi ahu ka o ruru, na usu nile nke ndi-agha Jehova siri n’ala Ijipt pua.

42 Abali nche ka ọ buru Jehova ime ka ha si n’ala Ijipt puta: otù abali ahu bu abali nche diri Jehova nke umu Israel nile nwere rue ọb͕ọ nile ha.

43 Jehova we si Moses na Eron, Nka bu ukpuru ngabiga ahu: ọ dighi onye ala ọzọ gēri ya:

44 ma orù ọ bula nke onye ọ bula, bú nke ejiri ego b͕ata, mb͕e i bìworo ya úgwù, mb͕e ahu o gēri ya.

45 Onye-nnọdu na onye egoro ọlu agaghi-eri ya.

46 N’otù ulo ka agēri ya; i gaghi-esi n’ulo wepu ihe ọ bula n’anu-aru-ya n’èzí; ọ dighi kwa ọkpukpu unu gētiji nime ya.

47 Nzukọ nile nke Israel gēme ya.

48 Ma mb͕e ọbìa gānọ n’ala-gi dika ọbìa, mb͕e ọ gēme-kwa-ra Jehova ememe ngabiga, ka ebìe nwoke ọ bula ọ nwere úgwù, mb͕e ahu ya biarue nso ime ya; ọ gādi kwa ka onye amuru n’ala: ma ọ dighi onye ọ bula anēbighi úgwù gēri ya.

49 Otù iwu ka ha gēnwe, bú onye amuru n’ala na ọbìa nke nọ dika ọbìa n’etiti unu.

50 Umu Israel nile we me ya; dika Jehova nyere Moses na Eron iwu, otú a ka ha mere.

51 O rue, n’otù ubọchi ahu, na Jehova mere ka umu Israel si n’ala Ijipt puta n’usu nile nke ndi-agha-ha.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 13

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Dorom nwa ọ bula eburu uzọ mu nsọ, bú nwa meghere àkpà-nwa ọ bula n’etiti umu Israel, ma n’etiti madu ma n’etiti anumanu: nkem ka ọ bu.

3 Moses we si ndi Israel, Cheta ubọchi a, nke ọ bu nime ya ka unu siworo n’Ijipt, n’ulo ndi-orù, puta; n’ihi na ike nke aka ka Jehova ji me ka unu si n’ebe a puta: agaghi-eri kwa achicha koro eko.

4 Ta ka unu onwe-unu nāputa n’ọnwa Ebib.

5 O gēru kwa, mb͕e Jehova gēme gi ka i ba n’ala nke ndi Kenean na ndi Het na ndi-Amorait na ndi-Haivait na ndi Jebus, nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, na i gēfè òfùfè a n’ọnwa nka.

6 Ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko, ma n’ubọchi nke-asa ememe di agēmere Jehova.

7 Achicha ekoghi-eko ka agēri n’ubọchi asa ahu; agaghi-ahu kwa achicha koro eko n’aka-gi, agaghi-ahu kwa ihe nēko achicha n’aka-gi n’ókè-ala-gi nile.

8 I gēgosi kwa nwa-gi n’ubọchi ahu, si, Ọ bu n’ihi ihe ahu Jehova merem mb͕e m’siri n’Ijipt puta.

9 Ọ gabu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama n’elu aka-gi, na ihe-ncheta n’etiti anya-gi abua, ka iwu Jehova we di n’ọnu-gi: n’ihi na aka di ike ka Jehova jiri me ka i si n’Ijipt puta.

10 I gēdebe kwa ukpuru a na mb͕e-ya akara àkà kwa-arọ.

11 O gēru kwa, mb͕e Jehova gēme ka i ba n’ala ndi Kenean, dika Ọ ṅuru gi na nna-gi-hà iyi, mb͕e Ọ gēnye kwa gi ya,

12 na i gēme ka nwa ọ bula nke meghere àkpà-nwa gabigara Jehova, ya na nwa ọ bula meghere àkpà-nwa, bú nwa anu-ulo muru, nke i nwere; ndi bu oké ka Jehova gēnwe.

13 Ma nwa ọ bula nke inyinya-ibu nke meghere àkpà-nwa, i gēwere nwa-aturu b͕aputa ya; ma ọ buru na i b͕aputaghi ya, i gāb͕aji kwa olu-ya: ọkpara ọ bula nke madu n’etiti umu-gi ka i gab͕aputa kwa.

14 O gēru kwa, mb͕e nwa-gi gāju gi n’ọdi-n’iru, si, Gini bu nka? na i gāsi ya, Ike nke aka ka Jehova jiri me ka ayi si n’Ijipt, n’ulo ndi-orù, puta:

15 o rue, mb͕e Fero mere ka o sie ike, bú izipu ayi, na Jehova b͕uru nwa ọ bula eburu uzọ mu n’ala Ijipt, ma nwa madu buru uzọ mu, ma nwa anumanu buru uzọ mu: n’ihi nka ka mu onwem nēwere nwa ọ bula meghere àkpà-nwa, bú oké, chuara Jehova àjà; ma ọkpara ọ bula nke umum, anamab͕aputa ya.

16 Ọ gābu kwa ihe-iriba-ama n’elu aka-gi, na nkpọ-n’iru n’etiti anya-gi abua: n’ihi na ike nke aka ka Jehova jiri me ka ayi si n’Ijipt puta.

17 O rue, mb͕e Fero zipuru ndi Israel, na Chineke edughi ha n’uzọ ala ndi Filistia, ọ bu ezie na nke ahu di nso; n’ihi na Chineke siri, Ka ndim we ghara icheghari uche mb͕e ha huru agha, we laghachi n’Ijipt:

18 ma Chineke dughariri ndi Israel, n’uzọ ọzara, n’uzọ Oké Osimiri Uhie: umu Israel chiri ihe-ekike-agha si n’ala Ijipt rigoputa.

19 Moses we buru ọkpukpu Josef mb͕e ọ jere: n’ihi na ọ mere ka umu Israel ṅusie iyi ike, ọ si, Chineke gēleta unu n’ezie; unu gēme kwa ka ọkpukpum so unu si n’ebe a rigopua.

20 Ha we si na Sukot bulie ije-ha, ma ulo-ikwū-ha n’Itam, na nsọtu ọzara.

21 Ma Jehova nēje n’iru ha n’ehihie n’ogidi igwe-oji, iduru ha n’uzọ; na n’abali n’ogidi ọku, inye ha ìhè; ka ha we nēje ehihie na abali:

22 ogidi igwe-oji ahu n’ehihie, na ogidi ọku ahu n’abali, adighi-apu n’iru ndi Israel.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 14

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Gwa umu Israel ka ha chigharia, ma ulo-ikwū-ha n’iru Pai-hahairot, n’etiti Migdol na oké osimiri, n’iru Beal-zefon: na ncherita-iru ya ka unu gāma ulo-ikwū-unu n’akuku oké osimiri.

3 Fero gēkwu kwa okwu bayere umu Israel, si, Ndi atuhiworo n’ala ka ha bu, ọzara emechibidowo ha nime.

4 M’gēme kwa ka obi Fero di ike, ọ gāchu kwa ha n’azu; agāsọpuru-kwam n’aru Fero na n’aru usu-ndi-agha-ya nile; ndi Ijipt gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova. Ha we me otú a.

5 Ewe gosi eze Ijipt na ndi Israel ab͕alagawo: obi Fero na ndi-orù-ya we chigharia imegide ndi Israel, ha si, Gini bu nka ayi meworo, na ayi ezipuwo Israel n’ifè ayi?

6 Ọ we jikere ub͕ọ-ala-ya, chiri kwa ndi-ya iso ya:

7 o chiri kwa nnù ub͕ọ-ala na ọgu iri arọputaworo, na ub͕ọ-ala nile nke Ijipt, na ndi-isi-agha n’elu ha nile.

8 Jehova we me ka obi Fero, bú eze Ijipt, di ike, ọ we chu umu Israel n’azu: umu Israel nēwere kwa aka di elu pua.

9 Ndi Ijipt we nāchu ha n’azu, bú inyinya nile nke ub͕ọ-ala nile nke Fero, na ndi-inyinya-ya, na usu-ndi-agha-ya, we rue ha aru ka ha nāma ulo-ikwū-ha n’akuku oké osimiri, n’akuku Pai-hahairot, n’iru Beal-zefon.

10 Fero we biarue nso, umu Israel we welie anya-ha, ma, le, ndi Ijipt nebuli ije n’azu ha; ha we tua egwu nke-uku: umu Israel we tikue Jehova.

11 Ha si Moses, Ọ̀ bu n’ihi na ílì adighi n’Ijipt na i chipuwo ayi inwu n’ọzara? gini bu nka i meworo ayi, n’ime ka ayi si n’Ijipt puta?

12 Ọ̀ bughi nka bu okwu nke ayi gwara gi n’Ijipt, si, Rapu ayi, ka ayi we fè ndi Ijipt? N’ihi na ọ di ayi nma ifè ndi Ijipt, kari inwu n’ọzara.

13 Moses we si ndi Israel, Unu atula egwu, guzonu onwe-unu n’ebe a, hu nzọputa Jehova, nke Ọ gēmere unu ta: n’ihi na ndi Ijipt ndi unu huworo ta, unu agaghi-ahu kwa ha ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.

14 Jehova gēburu unu agha, ma unu onwe-unu gāb͕a nkiti.

15 Jehova we si Moses, Gini mere i nētikum? gwa umu Israel ka ha bulie ije.

16 Gi onwe-gi weli kwa nkpa-n’aka-gi elu, setipu aka-gi n’elu oké osimiri, kewa ya: umu Israel gābà kwa n’etiti oké osimiri n’ala-akọrọ.

17 Ma Mu onwem, le, M’nēme ka obi ndi Ijipt di ike, ha gēso kwa ha n’azu ba: agāsọ-purukwam n’aru Fero, na n’aru usu-ndi-agha-ya nile, n’aru ub͕ọ-ala-ya nile, na n’aru ndi-inyinya-ya.

18 Ndi Ijipt gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e agāsọpurum n’aru Fero, na n’aru ub͕ọ-ala-ya nile, na n’aru ndi-inyinya-ya.

19 Mọ-ozi nke Chineke, nke nēje n’iru ọmuma-ulo-ikwū nke Israel, we bulie ije, je n’azu ha; ogidi igwe-oji ahu we si n’iru ha bulie ije, guzo n’azu ha:

20 ọ we bata n’etiti ọmuma-ulo-ikwū Ijipt na ọmuma-ulo-ikwū Israel; igwe-oji ahu na ọchichiri ahu we di, ma ọ nēnye ìhè n’abali: otù abiarughi kwa nso ibe-ya n’abali ahu nile.

21 Moses we setipu aka-ya n’elu oké osimiri; Jehova we were ifufe Iru-anyanwu di ike me ka oké osimiri ahu je n’azu n’abali ahu nile, Ọ we me oké osimiri ahu ka ọ buru ala-akọrọ, ewe kewa miri ahu.

22 Umu Israel we ba n’etiti oké osimiri ahu n’elu ala-akọrọ ahu: miri ahu we ghọrọ ha mb͕idi n’aka-nri-ha, na n’aka-ekpe-ha.

23 Ndi Ijipt we nāchu ha, so ha ba n’etiti oké osimiri, bú inyinya Fero nile, na ub͕ọ-ala-ya, na ndi-inyinya-ya.

24 O rue, nime iche-nche ututu, na Jehova lere ọmuma-ulo-ikwū ndi Ijipt anya n’ogidi ọku na igwe-oji, chusa ọmuma-ulo-ikwū ndi Ijipt.

25 O wezuga akpuru ukwu nke ub͕ọ-ala-ha, me ka ọ di ha arọ́ ime ka ha nāga: ndi Ijipt we si, Ka ayi b͕apu n’iru Israel; n’ihi na Jehova nēburu ha agha megide ndi Ijipt.

26 Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n’elu oké osimiri, miri ahu gālata kwa n’aru ndi Ijipt, n’aru ub͕ọ-ala-ha, na n’aru ndi-inyinya-ha.

27 Moses we setipu aka-ya n’elu oké osimiri, oké osimiri ahu we lata n’orùrù o nērù mb͕e nile mb͕e chi bọrọ; ndi Ijipt we nāb͕apu n’ọbibia-ya; Jehova we richapu ndi Ijipt n’etiti oké osimiri.

28 Miri ahu we lata, kpuchie ub͕ọ-ala nile, na ndi-inyinya, bú usu-ndi-agha nile nke Fero, ndi nēso ha n’azu ba nime oké osimiri; ọ dighi ma ọ buná otù onye fọduru nime ha.

29 Ma umu Israel jere ije n’elu ala-akọrọ n’etiti oké osimiri; miri ahu we ghọrọ ha mb͕idi n’aka-nri-ha na n’aka-ekpe-ha.

30 Jehova we zọputa Israel n’aka ndi Ijipt n’ubọchi ahu; Israel we hu ndi Ijipt ka ha nwuru anwu n’usọ oké osimiri.

31 Israel we hu aka uku nke Jehova ji megide ndi Ijipt, ndi Israel we tua egwu Jehova, kwere na Jehova, na n’orù-Ya Moses.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 15

1 Mb͕e ahu Moses na umu Israel nābukuru Jehova abù a, ha kwue, si,

Ka m’bukue Jehova abù, n’ihi na O biliwo elu nke-uku:

Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n’oké osimiri.

2 Ikem na abù ọmam ka Ja bu,

Ọ we ghọrọm nzọputa:

Onye a bu Chinekem, m’gēme kwa Ya ka Ọ di elu;

Chineke nke nnam, m’gēweli kwa Ya elu.

3 Jehova bu onye-agha:

Jehova bu aha-Ya.

4 Ub͕ọ-ala Fero nile na usu-ndi-agha-ya ka O tufuworo n’oké osimiri:

Ndi-isi-agha-ya arọputara arọputa, ha emikpuwo emikpu n’Oké Osimiri Uhie.

5 Ob͕u-miri nēkpuchi ha:

Ha aridawo na miri di omìmì dika nkume.

6 Jehova, aka-nri-Gi, nke di ebube n’ike,

Jehova, aka-nri-Gi nētipia onye-iro.

7 N’idi-ọtutu nke nbili-elu-Gi ka I nākwada ndi nēbili megide Gi:

I nēzipu iwe-Gi di ọku, o richapu ha dika ahihia-ọka.

8 Ewere iku-ume nke oghere-imi-Gi me ka miri tua obo,

Nrurù-miri guzoro onwe-ha ọtọ dika obo;

Ob͕u-miri raruru aruru n’obi oké osimiri.

9 Onye-iro siri,

M’gāchu, m’gēru ha aru, m’gēkesa ihe m’kwatara:

Nkpuru-obim gējuputa na ha,

M’gāmipu mma-agham, akam gā-napu ha ihe nile.

10 I were ifufe-Gi fe, oké osimiri kpuchiri ha:

Ha mikpuru dika opù nime miri di ebube.

11 Ònye di ka Gi n’etiti chi nile, Jehova?

Ònye di ka Gi, di ebube n’idi-nsọ?

Onye anātu egwu n’otuto nile, nēme ihe-ebube di iche iche.

12 I setiri aka-nri-Gi,

Ala elo ha.

13 N’ebere-Gi ka I duworo ndi nke I b͕aputaworo:

N’ike-Gi ka I duworo ha nwayọ rue ebe-obibi-Gi di nsọ.

14 Ndi ọzọ anuwo, ha ama jijiji:

Ihe-nb͕u eb͕uwo ndi bi na Filistia.

15 Mb͕e ahu ka obi lọrọ ndi-isi Edom miri:

Ebulu nke Moab, ọma-jijiji nējide ha:

Ndi nile bi na Kenean ab͕azewo.

16 Oké ujọ na oké egwù nādakwasi ha;

N’idi-uku nke ogwe-aka-Gi ha nọ jū dika nkume;

Rue mb͕e ndi-Gi gāgabiga, Jehova,

Rue mb͕e ndi nke I nwetara gāgabiga.

17 I gēme ka ha bata, I gāku kwa ha n’ugwu nke ihe-nketa-Gi,

Bú ọnọdu guzosiri ike I meworo, ka ọ we buru ebe I gēbi, Jehova,

Ebe di nsọ, Onye-nwe-ayi, nke aka-Gi abua meworo ka o guzosi ike.

18 Jehova gābu eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.

19 N’ihi na inyinya nile nke Fero, ha na ub͕ọ-ala-ya nile na ndi-inyinya-ya, bara nime oké osimiri, Jehova we me ka miri nke oké osimiri lata n’aru ha; ma umu Israel jere ije n’elu ala-akọrọ n’etiti oké osimiri.

20 Miriam, bú nwayi-amuma, bú nwa-nne-nwayi Eron, we were egwú-otiti n’aka-ya; ndinyom nile we chiri egwú-otiti na ite-egwú soro ya pua.

21 Miriam we za ha, si,

Unu bukue Jehova abù, n’ihi na O biliwo elu nke-uku;

Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n’oké osimiri.

22 Moses we me ka Israel si n’Oké Osimiri Uhie bulie ije, ha we pua ba n’ọzara Shua; ha we je ije ubọchi atọ n’ọzara ahu, ma ha achọtaghi miri.

23 Ha we biarue Mara, ma ha apughi iṅu miri nke Mara, n’ihi na ilu ka ha di: n’ihi nka akpọrọ aha-ya Mara.

24 Ndi Israel we tamu ntamu megide Moses, si, Gini ka ayi gāṅu?

25 Ọ we tikue Jehova; Jehova we me ka ọ hu otù osisi, ọ tubà ya na miri ahu, miri ahu we di utọ. N’ebe ahu ka O doro ukpuru na ikpé nye ha, ọ bu kwa n’ebe ahu ka Ọ nwara ha;

26 si, Ọ buru na i ge nti nke-ọma n’olu Jehova, bú Chineke-gi, ọ buru kwa na i me ihe nke ziri ezi n’anya-Ya, ọ buru kwa na i ṅa nti n’ihe Ọ nyere n’iwu, ọ buru kwa na i debe ukpuru-Ya nile, ọ dighi ọria ọ bula nke M’tiyere n’aru ndi Ijipt M’gētiye n’aru gi: n’ihi na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ka aru di gi nma.

27 Ha biarue Ilim, ebe isi-iyi iri na abua na ọgu nkwu atọ na iri di: ha we ma ulo-ikwū-ha n’ebe ahu n’akuku miri.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 16

1 Ha si n’Ilim bulie ije, nzukọ nile nke umu Israel we ba n’ọzara Sin, nke di n’etiti Ilim na Sainai, n’ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa nke-abua site n’ọpupu-ha n’ala Ijipt.

2 Nzukọ nile nke umu Israel we tamu ntamu megide Moses, megide kwa Eron, n’ọzara ahu:

3 umu Israel we si ha, Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi nwururi n’aka Jehova n’ala Ijipt, mb͕e ayi nọduru n’akuku ite anu, mb͕e ayi rijuru nri afọ; n’ihi na unu emewo ka ayi puta ba n’ọzara nka, iwere agu me ka nkpọkọta nka nile nwua.

4 Jehova we si Moses, Le, M’gaje ime ka nri si n’elu-igwe zoro unu dika miri; ndim gāpu, chikọta ihe nke otù ubọchi n’ubọchi-ya, ka M’we nwa ha, ma ha gēje ije n’iwum, ma-ọbu na ha agaghi-eje.

5 O gēru kwa, n’ubọchi nke-isi, na ha gēdozi ihe nke ha nāchibata, ọ gēme kwa okpukpu abua nke ha nāchikọta kwa-ubọchi.

6 Moses na Eron we si umu Israel nile, n’anyasi ka unu gāmara na Jehova emewo ka unu si n’ala Ijipt puta:

7 n’ututu ka unu gāhu kwa ebube nke Jehova; ebe Ọ nānu ntamu nile unu nātamu megide Jehova: ma àyi onwe-ayi bu gini, na unu nātamu ntamu megide ayi?

8 Moses we si, Nka gābu mb͕e Jehova gēnye unu anu n’anyasi ka unu rie, mb͕e Ọ gēnye kwa unu nri n’ututu ka unu riju afọ; ebe Jehova nānu ntamu unu onwe-unu nātamu megide Ya: ma àyi onwe-ayi bu gini? ha abughi imegide ayi, bú ntamu unu nātamu, kama imegide Jehova.

9 Moses we si Eron, Si nzukọ nile nke umu Israel, Biarunu nso n’iru Jehova: n’ihi na Ọ nuwo ntamu nile unu.

10 O rue, mb͕e Eron nāgwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, na ha chere ọzara iru, ma, le, ahuru ebube Jehova n’igwe-oji ahu.

11 Jehova we gwa Moses okwu, si,

12 Anuwom ntamu nile nke umu Israel: gwa ha okwu, si, N’etiti ehihie na anyasi ka unu gēri anu, n’ututu ka unu gēriju kwa afọ na nri; unu gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

13 O rue, n’anyasi, na nnunu quail rigotara, kpuchie ebe ọmuma-ulo-ikwū-ha: n’ututu igirigi we dikwasi n’ala buru-buru ọmuma-ulo-ikwū.

14 Mb͕e igirigi nke dikwasi n’ala rigoro, le, n’elu ọzara imurimu ihe nke ekpere ekpè, imurimu ihe dika hoar frost nke di n’elu ala.

15 Umu Israel we hu ya, sirita onwe-ha, Gini ka ọ bu? n’ihi na ha amaghi ihe ọ bu. Moses si ha, Nke ahu bu nri nke Jehova nyeworo unu ka unu rie.

16 Nka bu ihe Jehova nyere n’iwu, Chikọtanu ufọdu nime ya, onye ọ bula dika oriri-ya si di; otù ọtùtù omer otù isi, dika ọnu-ọgugu madu-unu si di, ka unu gēwere ya, onye ọ bula o were ndi nọ n’ulo-ikwū-ya.

17 Umu Israel we me otú a, chikọta, otù onye nāchikọta ri nne, nke-ọzọ nāchikọta nke ntà.

18 Ha we were omer tùa ya, onye chikọtara ri nne enweghi kari nke gēzuru ya, onye chikọta-kwa-ra nke ntà, ọ dighi ihe fọduru ya inwe; onye ọ bula dika oriri-ya si di, otú a ka ha chikọtara.

19 Moses we si ha, Ka onye ọ bula ghara ime ka ufọdu nime ya fọdu rue ututu.

20 Ma ha egeghi Moses nti; madu ufọdu nime ha we me ka ufọdu nime ya fọdu rue ututu, o we b͕a ikpuru, nēsì ísì: Moses we we iwe n’aru ha.

21 Ha we nāchikọta ya kwa-ututu, onye ọ bula dika oriri-ya si di: ma mb͕e anyanwu di ọku ọ b͕aze.

22 O rue, n’ubọchi nke-isi, na ha chikọtara nri okpukpu abua, ha nwere omer abua n’otù n’otù: ndi-isi nile nke nzukọ we bia, gosi Moses.

23 Ọ si ha, Nke ahu bu ihe Jehova kwuworo, si, Idebe-ubọchi-izu-ike, bú ubọchi-izu-ike di nsọ nye Jehova, ka echi bu: ihe unu nēghe, ghenu ya, ihe unu nēsi kwa, sienu ya; ma ihe nile nke fọduru, dọbaranu onwe-unu ya, ka ọ buru ihe-ndebe rue ututu.

24 Ha we dọba ya rue ututu, dika Moses nyere iwu: ma o sìghi ísì, ikpuru adighi kwa nime ya.

25 Moses we si, Rienu ya ta; n’ihi na ubọchi-izu-ike diri Jehova ka ta bu: ta unu agaghi-achọta ya n’ọhia.

26 Ubọchi isi ka unu gāchikọta ya; ma n’ubọchi nke-asa ka ubọchi-izu-ike di, ọ dighi nke gādi nime ya.

27 O rue, n’ubọchi nke-asa, na ufọdu nime ndi Israel puru apu ichikọta, ma ha achọtaghi.

28 Jehova we si Moses, Rùe ole mb͕e ka unu nāju idebe ihe nile M’nyere n’iwu na iwum nile?

29 Lenu, n’ihi na Jehova enyewo unu ubọchi-izu-ike, n’ihi nka Ya onwe-ya nēnye unu nri nke ubọchi abua n’ubọchi nke-isi; nọdunu, onye ọ bula n’ebe ọ nọ, ka onye ọ bula ghara isi n’ọnọdu-ya pua n’ubọchi nke-asa.

30 Ndi Israel we kwusi ilu ọlu n’ubọchi nke-asa.

31 Ulo Israel we kpọ aha-ya Manna: ihe ahu di ka nkpuru coriander, ọ di ọcha; idetu ya ire ọ di ka achicha wafer eji manu-aṅu me.

32 Moses we si, Nka bu ihe Jehova nyeworo n’iwu, si, Ka nju omer nime ya buru ihe-ndebe anēdebere ọb͕ọ nile unu; ka ha we hu nri M’mere ka unu rie n’ọzara, mb͕e M’mere ka unu si n’ala Ijipt puta.

33 Moses we si Eron, Were otù ite, tiye nju omer nke manna nime ya, dọba ya n’iru Jehova ka ọ buru ihe-ndebe anēdebere ọb͕ọ nile unu.

34 Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka Eron dọbara ya n’iru Ihe-àmà, ka ọ buru ihe-ndebe.

35 Umu Israel we rie manna ahu ọgu arọ abua, rue mb͕e ha batara n’ala ebí ebí; manna ahu ka ha riri, rue mb͕e ha batara na nsọtu ala Kenean.

36 Ma omer, otù uzọ n’uzọ iri nke ọtùtù ephah ka ọ bu.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 17

1 Nzukọ nile nke umu Israel we si n’ọzara Sin bulie ije, na nbuli-ije nile ha, n’okwu-ọnu Jehova, ha we ma ulo-ikwū-ha na Refidim: ma ọ dighi miri ndi Israel gāṅu.

2 Ndi Israel we so Moses se okwu, si, Nyenu ayi miri ka ayi ṅua. Moses we si ha, Gini mere unu som nēse okwu? gini mere unu nānwa Jehova?

3 Akpiri miri we kpọ ndi Israel nku n’ebe ahu; ndi ahu we tamu ntamu megide Moses, si, ọ̀ bu kwa n’ihi gini ka i meworo ka ayi si n’Ijipt rigota, iwere akpiri-ikpọ-nku me ka ayi na umu-ayi na anu-ulo-ayi, nwua?

4 Moses we tikue Jehova, si, Gini ka m’gēme ndi nka? ọ fọduru ihe ntà ka ha tub͕uem na nkume.

5 Jehova we si Moses, Gabiga n’iru ndim, chiri kwa ufọdu nime ndi-okenye Israel ka ha so gi je; nkpa-n’aka-gi kwa, nke i ji ti osimiri Nail, were ya n’aka-gi, je.

6 Le, M’gaje iguzo n’iru gi n’ebe ahu n’elu oké nkume nime Horeb, i gēti oké nkume ahu ihe, miri gēsi kwa nime ya puta, ka ndim we ṅua. Moses we me otú a n’anya ndi-okenye Israel.

7 O we kpọ aha ebe ahu Masa, na Meriba, n’ihi ise-okwu nke umu Israel, na n’ihi na ha nwara Jehova, si, Jehova, Ọ̀ nọ n’etiti ayi, ma-ọbu na Ọ nọghi?

8 Amalek we bia, buso Israel agha nime Refidim.

9 Moses we si Joshua, Rọputara ayi ndikom, pua, buso Amalek agha; echi mu onwem ganēguzo onwem n’elu ugwu ntà nka, nējide nkpa-n’aka Chineke n’akam.

10 Joshua we me dika Moses siri ya, ibuso Amalek agha: ma Moses na Eron na Hua rigoro n’elu ugwu ntà ahu.

11 O rue, mb͕e Moses weliri aka-ya elu, na Israel kariri ike: ma mb͕e o mere ka aka-ya zuru ike, Amalek kariri ike.

12 Ma aka Moses abua di arọ́; ha we were nkume, tiye ya n’okpuru ya, ọ nọkwasi ya; Eron na Hua we jide aka-ya abua elu, otù onye n’otù akuku, ibe-ya n’akuku ọzọ; aka-ya abua we nēguzosi ike rue ọdida-anyanwu.

13 Joshua we me ka ike gwu Amalek n’ọnu mma-agha.

14 Jehova we si Moses, De nka n’akwukwọ, ka ọ buru ihe-ncheta, me kwa ka ọ ba na nti Joshua: n’ihi na M’gēhichapusi ncheta Amalek n’okpuru elu-igwe.

15 Moses we wue ebe-ichu-àjà, kpọ aha-ya Jehova-nisi:

16 ọ si, Aka dikwasi oche-eze Ja, agha ka Jehova gēbuso Amalek site n’ọb͕ọ rue ọb͕ọ.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 18

1 Ma Jetro, bú onye-nchu-àjà Midian, nna nwunye Moses, nuru ihe nile Chineke mere Moses na Israel ndi-Ya, na Jehova mere ka Israel si n’Ijipt puta.

2 Jetro, bú nna nwunye Moses, we were Zipora, bú nwunye Moses, mb͕e o zipusiri ya,

3 na umu-ya ndikom abua; nke aha otù nime ha bu Giashom; n’ihi na ọ siri, Ọbìa ka m’buworo n’ala ọzọ:

4 aha nke ibe-ya bu kwa Elieza; n’ihi na ọ siri, Chineke nke nnam bu iye-akam, Ọ we naputam na mma-agha Fero:

5 Jetro, bú nna nwunye Moses, we biakute Moses, ya na umu-ya ndikom na nwunye-ya, nime ọzara ebe ya onwe-ya maworo ulo-ikwū, n’ugwu nke Chineke.

6 Ọ si Moses, Mu onwem, nna nwunye-gi, bú Jetro, abiakutewom i, mu na nwunye-gi, na umu-ya ndikom abua tiyere ya.

7 Moses we pua izute nna nwunye-ya, we kpọ isi ala, sutu kwa ya ọnu; ha we jurita onwe-ha ma ha nọ n’udo; ha we ba n’ulo-ikwū.

8 Moses we kọrọ nna nwunye-ya akukọ ihe nile Jehova mere Fero na ndi Ijipt n’ihi Israel, ike-ọgwugwu nile nke gwuru ha n’uzọ, Jehova we naputa ha.

9 Jetro we ṅuria ọṅu bayere ezi ihe nile nke Jehova mere Israel, ndi ọ naputara n’aka ndi Ijipt.

10 Jetro we si, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye naputaworo unu n’aka ndi Ijipt, na n’aka Fero; Onye naputaworo ndi nka n’okpuru aka ndi Ijipt.

11 Ub͕u ka m’mara na Jehova di uku kari chi nile: e, n’ihe nke ha di nganga megide ha.

12 Jetro, bú nna nwunye Moses, we were àjà-nsure-ọku na àjà di iche iche ichuru Jehova: Eron we bia, ya na ndi-okenye nile nke Israel, iso nna nwunye Moses ri nri n’iru Chineke.

13 O rue, n’echi-ya, na Moses nọduru ala ikpe ndi Israel ikpe: ndi ahu we guzo n’akuku Moses si n’ututu rue anyasi.

14 Nna nwunye Moses we hu ihe nile nke Moses onwe-ya nēme ndi Israel, ọ we si, Gini bu ihe a nke gi onwe-gi nēme ndi nka? gini mere gi onwe-gi nānọdu ala nání gi iche, ma ndi nka nile nēguzo onwe-ha n’akuku gi si n’ututu rue anyasi?

15 Moses we si nna nwunye-ya, N’ihi na ndi nka nābiakutem iju Chineke ase:

16 mb͕e ha nwere okwu, ha abiakutem; m’nēkpe kwa ikpe n’etiti madu na ibe-ya, m’nēme kwa ka ha mara ukpuru nile nke Chineke, na iwu-Ya nile.

17 Nna nwunye Moses we si ya, Ọ dighi nma, bú ihe gi onwe-gi nēme.

18 I ghaghi ikpọnwu akpọnwu dika akwukwọ, ma gi onwe-gi ma ndi nka gi na ha nọ: n’ihi na ọ di arọ́ kari gi, bú ihe a; i pughi ime ya nání gi iche.

19 Ub͕u a ge nti n’olum, m’gādu gi ọdu, ka Chineke nọyere kwa gi: gi onwe-gi buru ndi nka na ncherita-iru Chineke, gi onwe-gi webata-kwa-ra Chineke okwu nile,

20 me kwa ka ha ghọta ukpuru nile na iwu nile, gi me kwa ka ha mara uzọ ha gēje ije nime ya, na ọlu nke ha gālu.

21 Gi onwe-gi gēsi kwa na ndi nka nile leputa ndi-dìnkpà, ndi nātu egwu Chineke, ndi nēkwu ezi-okwu, ndi nākpọ urù nēzighi ezi asì; i gēdo kwa ndi ahu n’isi ha, ibu ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi iri iri:

22 ka ha kpe ndi nka na mb͕e nile: o gēru, na oké okwu nile ọ bula ka ha gēwetara gi, ma ha onwe-ha gēkpe okwu ntà nile ọ bula: gi me ka ọ di kari nfe n’aru gi, ha gēso kwa gi buru ibu a.

23 Ọ buru na ihe a ka i gēme, ọ buru kwa na Chineke enye gi iwu, i gēnwe kwa ike iguzo; ọzọ kwa, ndi nka nile gābà kwa n’ọnọdu-ha n’udo.

24 Moses we ge nti n’olu nna nwunye-ya, me ihe nile ọ siri.

25 Moses we si n’etiti Israel nile rọputa ndi-dìnkpà, me ha ka ha buru ndi-isi ndi ahu, ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi iri iri.

26 Ha we kpe ndi Israel ikpe na mb͕e nile: okwu nile nke siri ike ka ha nēwetara Moses, ma ha onwe-ha nēkpe okwu ntà nile.

27 Moses we zipu nna nwunye-ya; o we je nke ya, la n’ala-ya.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 19

1 N’ọnwa nke-atọ mb͕e umu Israel putasiri n’ala Ijipt, n’ubọchi ahu ka ha batara n’ọzara Sainai.

2 Ha we si na Refidim bulie ije, bata n’ọzara Sainai, we ma ulo-ikwū-ha n’ọzara ahu; Israel we ma ulo-ikwū-ha n’ebe ahu n’iru ugwu ahu.

3 Moses we rigokuru Chineke, Jehova we si n’ugwu ahu kpọ ya òkù, si, Otú a ka i gāsi ulo Jekob, gosi kwa umu Israel;

4 Unu onwe-unu ahuwo ihe M’mere ndi Ijipt, ebu-kwa-ram unu n’elu nkù ugo, me ka unu biakutem.

5 Ma ub͕u a, ọ buru na unu ege nti n’olum n’ezie, ọ buru kwa na unu edebe ọb͕ub͕a-ndum, unu gābu-kwa-ram ihe nke akam kari ndi nile: n’ihi na ọ bu Mu nwe uwa nile:

6 unu onwe-unu gābu-kwa-ram ala-eze ndi-nchu-àjà, na mba di nsọ. Ndia bu okwu nke i gāgwa umu Israel.

7 Moses we bia, kpọ ndi-okenye ndi Israel, tiye okwu ndia nile n’iru ha, bú nke Jehova nyere ya n’iwu.

8 Ndi Israel nile we za n’otù, si, Ihe nile Jehova kwuru, ayi gēme ya. Moses we weghachiri Jehova okwu nile nke ndi ahu.

9 Jehova we si Moses, Le, Mu onwem nābiakute gi n’igwe-oji b͕ara ọchichiri, ka ndim we nu mb͕e M’nākpa-yere gi uka, ọzọ kwa, ka ọ we buru gi onwe-gi ka ha gēkwere rue mb͕e ebighi-ebi. Moses we gosi Jehova okwu nile nke ndi Israel.

10 Jehova we si Moses, Jekuru ndim, do ha nsọ ta na echi, ka ha su kwa uwe-nb͕okwasi-ha,

11 nọ na njikere nye ubọchi nke-atọ: n’ihi na ọ bu n’ubọchi nke-atọ ka Jehova gāridata n’anya ndi Israel nile n’elu ugwu Sainai.

12 I gākpara ndim ókè buruburu, si, Lezienu onwe-unu anya, ka unu ghara irigo n’ugwu a, ma ọbu imetu nsọtu-ya aka: onye ọ bula nke nēmetu ugwu a aka, aghaghi ime ka ọ nwua:

13 ọ dighi aka gēmetu ya, n’ihi na aghaghi itub͕u ya na nkume, ma-ọbu ib͕ab͕u ya n’àkú; ma anumanu ma madu, ọ gaghi-adi ndu: n’ọfùfù-opì di anya ndi ahu gārigota n’ugwu a.

14 Moses we si n’ugwu ahu ridakuru ndi Israel, do ndi ahu nsọ; ha we su uwe-nbokwasi-ha.

15 Ọ si ndi Israel, Nọnu na njikere nye ubọchi nke-atọ: unu abiarula nwayi nso.

16 O rue, n’ubọchi nke-atọ, mb͕e ọ bu ututu, na ọtútú éb͕è-elu-igwe na àmùmà di, na igwe-oji di arọ́ n’elu ugwu ahu, na olu opì-ike di ike nke-uku; ndi Israel nile ndi nọ n’ọmuma-ulo-ikwū-ha we ma jijiji.

17 Moses we me ka ndi Israel si n’ọmuma-ulo-ikwū-ha puta izute Chineke, ha we guzo onwe-ha n’ala-ala nke ugwu ahu.

18 Ugwu Sainai nile nākwu anwurù, n’ihi na Jehova ridakwasiri ya n’ọku: anwurù-ya we kwugo dika anwurù nke oké ọku, ugwu ahu nile we ma jijiji nke-uku.

19 Olu opì-ike ahu we nādasi ike nke-uku, Moses nēkwu okwu, Chineke were kwa olu nāza ya.

20 Jehova we rida-kwasi ugwu Sainai, rue elu ugwu ahu: Jehova we kpọ Moses ibiaru elu ugwu ahu, Moses we rigo.

21 Jehova we si Moses, Rida, b͕ara ndim àmà, ka ha we ghara inujuru n’ebe Jehova nọ ile anya, ọtútú nime ha we da.

22 Ọzọ kwa, ndi-nchu-àjà, ndi nābiakute Jehova nso, ka ha do onwe-ha nsọ, ka Jehova we ghara itiwakuru ha.

23 Moses we si Jehova, Ndi-Gi apughi irigoru ugwu Sainai: n’ihi na Gi onwe-gi b͕ara ayi àmà, si, Kpara ugwu a ókè, do kwa ya nsọ.

24 Jehova si ya, Je, rida; i gārigota kwa, gi onwe-gi, na Eron tiyere gi: ma ka ndi-nchu-àjà na ndim ghara inujuru irigokute Jehova, ka O we ghara itiwakuru ha.

25 Moses we ridakuru ndi Israel, si ha me otú a.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 20

1 Chineke we kwue okwu ndia nile, si,

2 Mu onwem bu Jehova Chineke-gi, Onye mere ka i si n’ala Ijipt, n’ulo ndi-orù, puta.

3 Gi enwela Chi ọzọ tiyerem.

4 Gi emerela onwe-gi arusi apiri api, ma-ọbu oyiyi nke udi ọ bula nke di n’elu-igwe n’elu, ma-ọbu nke di n’uwa n’okpuru ya, ma-ọbu nke di na miri n’okpuru uwa:

5 gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n’ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì;

6 ma anamemere nnù umu-umu abua na ọgu iri ebere, bú nke ndi nāhum n’anya, nēdebe kwa ihe nile M’nyere n’iwu.

7 Gi eburula aha Jehova, bú Chineke-gi, ime ihe efu; n’ihi na Jehova agaghi-agu onye nēburu aha-Ya ime ihe efu n’onye ikpé nāmaghi.

8 Cheta ubọchi-izu-ike, ido ya nsọ.

9 Ubọchi isi ka i gālu ọlu, je ozi-gi nile:

10 ma ubọchi nke-asa bu ubọchi-izu-ike nke Jehova, bú Chineke-gi, nwere: i gaghi-eje ozi ọ bula nime ya, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na anu-ulo-gi, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula:

11 n’ihi na n’ubọchi isi ka Jehova mere elu-igwe na uwa, na oké osimiri, na ihe nile nke di nime ha, Ọ we zuru ike n’ubọchi nke-asa: n’ihi nka ka Jehova gọziri ubọchi-izu-ike, do kwa ya nsọ.

12 Sọpuru nna-gi na nne-gi: ka ubọchi-gi we di anya n’elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.

13 Gi eb͕ula madu.

14 Gi akwala iko.

15 Gi ezula ori.

16 Gi ab͕ala àmà ugha megide madu-ibe-gi.

17 Gi enwela anya-uku n’ebe ulo madu-ibe-gi di, gi enwela anya-uku n’ebe nwunye madu-ibe-gi nọ, ma-ọbu n’ebe orù-ya nwoke nọ, ma-ọbu n’ebe orù-ya nwayi nọ, ma-ọbu n’ebe ehi-ya di, ma-ọbu n’ebe inyinya-ibu-ya di, ma-ọbu n’ebe ihe ọ bula di nke madu-ibe-gi nwere.

18 Ndi Israel nile we nāhu éb͕è-elu-igwe nile, na ire-ọku nile, na olu opì-ike ahu, na ugwu ahu ka ọ nākwu anwurù: mb͕e ndi ahu huru ya ha we ṅaghari, guzo n’ebe di anya.

19 Ha si Moses, Gi onwe-gi kpayere ayi uka, ayi gānu kwa: ma Chineke akpayerela ayi uka, ka ayi we ghara inwu.

20 Moses we si ndi Israel, Unu atula egwu: n’ihi na ọ bu inwa unu ka Chineke biaworo, ya na ka egwù-Ya we di n’iru unu, ka unu we ghara imehie.

21 Ndi Israel we guzo n’ebe di anya, ma Moses biaruru oké ọchichiri ahu nso, ebe Chineke nọ.

22 Jehova we si Moses, Otú a ka i gāsi umu Israel, Unu onwe-unu ahuwo na esiwom n’elu-igwe kpayere unu uka.

23 Unu emela chi ọzọ tiyerem; chi ọla-ọcha ma-ọbu chi ọla-edo, unu emerela onwe-unu ha.

24 Ebe-ichu-àjà nke ájá ka i gēmerem, chu kwa àjà-nsure-ọku-gi nile na àjà-udo-gi nile n’elu ya, bú ìgwè ewu na aturu-gi, na ìgwè ehi-gi: n’ebe nile ọ bula ebe M’nēme ka echeta aham, n’ebe ahu ka M’gābiakute gi, gọzi kwa gi.

25 Ma ọ buru na ebe-ichu-àjà nke nkume ka i gēmerem, ewerela nkume awara awa wu ya: n’ihi na asi na i mewo ka ihe-ọlu-gi ga n’elu ya, i we me ka ọ ghara idi nsọ.

26 Ewerela ihe-nrigo rigo n’ebe-ichu-àjàm, ka ewe ghara ikpughe ọtọ-gi n’elu ya.