Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 1

1 Ma ndia bu aha umu-ndikom Israel, ndi batara n’Ijipt; ha soro Jekob bata, nwoke ọ bula na ulo-ya.

2 Reuben, na Simeon, na Livai, na Juda;

3 Isaka, na Zebulun, na Benjamin;

4 Dan, na Naftali, na Gad, na Asha.

5 Madu nile ndi si n’úkwù Jekob puta di kwa ọgu madu atọ na iri: ma Josef, ọ nọri n’Ijipt.

6 Josef we nwua, ya na umu-nne-ya nile, na ọb͕ọ ahu nile.

7 Ma umu Israel muru ọmùmù, ri nne, ba uba, we nwe ume nke uku; ala ahu we juputa na ha.

8 Ma eze ọhuu biliri ichi Ijipt, onye nāmaghi Josef.

9 Ọ we si ndi-ya, Le, ndi umu Israel di ọtutu nwe kwa ume kari ayi:

10 ngwa, ka ayi gosi onwe-ayi na ndi mara ihe n’ebe ha nọ; ka ha we ghara iba uba, o we rue, mb͕e agha gāda n’ala-ayi, na ha gētiyekọta onwe-ha n’aru ndi nākpọ ayi asì, ha we buo agha megide ayi, si n’ala nka rigopua.

11 Ha we do ndi-isi nke ndi nēfè òfùfè n’isi ha iwere ibu-ha weda ha ala. Ha we wuere Fero obodo abua ichikobata ihe, bú Paitom na Raamses.

12 Ma dika ha nēweda ha ala, otú a ka ha nāba uba, otú a ka ha nāb͕asa kwa. Ike we gwusia ha n’ihi umu Israel.

13 Ndi Ijipt we were nkpab͕u me umu Israel ka ha fè òfùfè:

14 ha we were òfùfè siri ike me ka ndu-ha di ilu, n’urọ, na nime brick, na n’òfùfè nile ọ bula n’ọhia, òfùfè-ha nile nke ha mere ka ha fè nime ha di na nkpab͕u.

15 Eze Ijipt we si ndinyom Hibru ndi nēle ime, ndi aha otù onye nime ha bu Shifra, aha nke onye nke-abua bu kwa Pua:

16 ọ si, Mb͕e unu nēle ime ndinyom Hibru, we hu ha n’elu oche ọmumu-nwa; ọ buru na nwa-nwoke ka ọ bu, unu gēme kwa ka ọ nwua; ma ọ buru na nwa-nwayi ka ọ bu, ọ gādi kwa ndu.

17 Ma ndinyom nke nēle ime nātu egwu Chineke, ha emeghi kwa dika eze Ijipt gwara ha, ma ha debere umu-ndikom ndu.

18 Eze Ijipt we kpọ ndinyom ahu nēle ime, ọ si ha, Gini mere unu ji me ihe a, we debe umu-ndikom ndu?

19 Ndinyom nēle ime we si Fero, N’ihi na ndinyom Hibru adighi ka ndinyom Ijipt; n’ihi na ndi nwere ndu ka ha bu, ha nāmu kwa nwa tutu ndinyom nke nēle ime abiakute ha.

20 Chineke we me ndinyom nēle ime nma: ndi Israel we ba uba, nwe kwa ume nke-uku.

21 O rue, n’ihi na ndinyom nke nēle ime nātu egwu Chineke, na O mere èzí-na-ulo nye ha.

22 Fero we nye ndi-ya nile iwu, si, Nwa-nwoke ọ bula amuru, n’osimiri Nail ka unu gētufu ya, ma unu gēdebe nwa-nwayi ọ bula ndu.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 2

1 Otù nwoke nke sitere n’ulo Livai we je luru nwa-nwayi Livai na nwunye.

2 Nwayi ahu we turu ime, mua nwa-nwoke: mb͕e ọ huru ya na nwa mara nma ka ọ bu, o zobe ya ọnwa atọ.

3 Ọ pughi kwa izobe ya ọzọ, ọ we meere ya ub͕ọ papyrus, were kwa bitumen na pitch te ya; o we tiye nwa ahu nime ya, tiye ya n’etiti ami n’usọ osimiri Nail.

4 Nwa-nne-ya nwayi we guzo onwe-ya n’ebe di anya, imara ihe gēme ya.

5 Nwa-nwayi Fero we ridata isa aru n’osimiri Nail; umu-ab͕ọghọ-ya we nējeghari n’akuku osimiri Nail ahu; o we hu ub͕ọ ahu n’etiti ami, zìe orù-ya nwayi iweta ya.

6 O we meghe ya, hu nwa ahu, ma, le, ọ bu nwata-nwoke nākwa ákwá. O we nwe ọmiko n’aru ya, si, Otù nime umu ndi-Hibru ka nka bu.

7 Nwa-nne-ya nwayi we si nwa-nwayi Fero, #M’gēje kpọrọ gi nwayi nēnye nwa ara site na ndinyom Hibru, ka ọ we nyere gi nwa nka ara?

8 Nwa-nwayi Fero we si ya, Je. Nwa-ab͕ọghọ ahu we je kpọ nne nwa ahu.

9 Nwa-nwayi Fero we si ya, Kuru nwa nka la, nyerem ya ara, mu onwem gēnye kwa gi ugwọ-ọlu-gi. Nwayi ahu we kuru nwa ahu, nye ya ara.

10 Nwa ahu we tó etó, nne-ya we me ka ọ biakute nwa-nwayi Fero, ọ we ghọrọ ya nwa nke ya. Ọ kpọ aha-ya Moses, si, N’ihi na nime miri ka m’dọputara ya.

11 O rue na mb͕e ahu, mb͕e Moses toputaworo, na ọ pukuru umu-nne-ya, ihu ihe ngbu ha anya: o we hu nwoke Ijipt ka o nētib͕u nwoke Hibru, otù nime umu-nne-ya.

12 Ọ we lee anya n’otù akuku, lee kwa anya n’akuku ọzọ, ma mb͕e ọ huru na ọ dighi onye ọ bula, o tib͕ue onye Ijipt ahu, zobe ya n’ájá.

13 Ọ we pua n’ubọchi nke-abua, ma, le, ndikom Hibru abua nālu ọ̀gù: ọ we si onye ahu nke ikpe mara, N’ìhi gini ka i nētib͕u nwanne gi?

14 Ọ si, Ònye mere gi ka i buru onye-isi na onye-ikpe n’ebe ayi nọ. Ọ̀ bu ib͕um ka gi onwe-gi nēkwu okwu-ya, dika i b͕uru onye Ijipt? Moses we tua egwu, si, N’ezie amawo okwu a.

15 Fero we nu okwu a, ọ we chọ ib͕u Moses. Moses we b͕apu n’iru Fero, nọdu n’ala Midian: o we nọdu ala n’akuku olùlù-miri.

16 Ma onye-nchu-àjà Midian nwere umu-ndinyom asa: ha we bia, se miri, b͕aju ebe anētiye miri ime ka ìgwè ewu na aturu nke nna-ha ṅua.

17 Ndi-ọzùzù-aturu we bia, chupu ha: ma Moses biliri, zọputa ha, me ka ìgwè ewu na aturu-ha ṅua miri.

18 Ha we biakute Reuel, bú nna-ha, ọ si, Gini mere unu ji bia ngwa ngwa ta?

19 Ha si, Nwoke Ijipt o setara ayi miri nke-ọma, me ka ìgwè ewu na aturu-ayi ṅua.

20 Ọ si umu-ya ndinyom, Òle ebe ọ nọ kwa? n’ìhi gini bu nka na unu arapuwo nwoke ahu? kpọnu ya, ka o we rie nri.

21 Moses we kwere ibiri n’ulo nwoke ahu: o we nye Moses Zipora nwa-ya nwanyi na nwunye.

22 Nwanyi ahu we mua nwa-nwoke, Moses we kpọ aha-ya Giashom: n’ihi na ọ siri, Ọbìa ka m’bu-woro n’ala ọzọ.

23 O rue, n’ọtutu ubọchi ahu, na eze Ijipt nwuru: umu Israel we nēze ume n’ihi òfùfè-ha, ha we tie nkpu, ntiku ha tikuru Chineke we rigorue Chineke nti, n’ihi òfùfè ahu.

24 Chineke we nu isu-ude-ha, Chineke we cheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya, nke Ya na Abraham na Aisak na Jekob b͕ara.

25 Chineke we hu umu Israel, Chineke we mara.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 3

1 Ma Moses nāzù ìgwè ewu na aturu nke Jetro, bú nna nwunye-ya, bú onye-nchu-àjà Midian: ọ we duru ìgwè ewu na aturu ahu ga n’azu ọzara, ọ we biarue ugwu nke Chineke, rue Horeb.

2 Mọ-ozi nke Jehova we me ka ọ hu ya anya n’ire ọku site n’etiti osisi ntà: o we hu, ma, le, osisi ntà ahu nēre ọku, ma erepiaghi osisi ntà ahu.

3 Moses we si, Ka m’wezuga onwem, hu oké ihe-ọhuhu nka; gini mere osisi ntà ahu nējighi rechapu?

4 Jehova we hu na o wezugara onwe-ya ihu, Chineke we si n’etiti osisi ntà ahu kpọ ya òkù, si, Moses, Moses. Ọ si, Lekwam.

5 Ọ si, Abiarula nso ebe a: yipu akpukpọ-ukwu-gi n’ukwu-gi abua, n’ihi na ebe nke gi onwe-gi nēguzo n’elu ya, ala nsọ ka ọ bu.

6 Ọ si kwa, Mu onwem bu Chineke nke nna-gi, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob. Moses we zobe iru-ya; n’ihi na ọ nātu egwu ilegide Chineke anya.

7 Jehova we si, Ahuwom n’ezie nweda-n’ala nke ndim nke di n’Ijipt, anuwokwam iti-nkpu-ha n’ihi ndi nāchi ha n’ihe-ike; n’ihi na amawom ihe-nb͕u-ha nile;

8 M’we ridata inaputa ha n’aka ndi Ijipt, na ime ka ha si n’ala ahu rigorue ala di nma nke sa-kwa-ra mbara, rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya; rue ebe nke ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus.

9 Ma ub͕u a, le, iti-nkpu umu Israel eruwom nti: ọzọ kwa, ahuwom nmeb͕u nke ndi Ijipt nēmeb͕u ha.

10 Ub͕u a kwa, bia, M’gēzì kwa gi jekuru Fero; gi me kwa ka ndim, bú umu Israel, si n’Ijipt puta.

11 Ma Moses siri Chineke, Ònye ka m’bu, na m’gējekuru Fero, na m’gēme kwa ka umu Israel si n’Ijipt puta?

12 Ọ si, N’ihi na Mu na gi gānọ; nka bu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama na Mu onwem ezigawo gi: mb͕e i gēme-wori ka ndim si n’Ijipt puta, unu gēfè Chineke n’elu ugwu a.

13 Moses we si Chineke, Le, mb͕e mu onwem nābiakute umu Israel, si ha, Chineke nke nna-unu-hà ezitewom n’ebe unu nọ; mb͕e ha gāsikwam, Gini bu aha-Ya? ọ̀ bu gini ka m’gāsi ha?

14 Chineke we si Moses, ABUM IHE M’BU: Ọ si kwa, Otú a ka i gāsi umu Israel, ABUM ezitewom n’ebe unu nọ.

15 Chineke si-kwa-ra Moses ọzọ, Otú a ka i gāsi umu Israel, Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob, O zitewom n’ebe unu nọ: nka bu aham rue mb͕e ebighi-ebi, nka bu kwa ihe-nchetam rue ọb͕ọ nile.

16 Je, chikọta ndi-okenye Israel, si ha, Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, Chineke nke Abraham na Aisak na Jekob, Ọ mewom ka m’hu Ya anya, Ọ si, Eletawom unu n’ezie, hu kwa ihe anēme unu n’Ijipt:

17 M’we si, M’gēme ka unu si na nweda-n’ala nke Ijipt rigorue ala nke ndi Kenean na ndi Het na ndi-Amorait na ndi-Perizait na ndi-Haivait na ndi Jebus, rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya.

18 Ha gēge kwa nti n’olu-gi: i gābiakute kwa eze Ijipt, gi onwe-gi na ndi-okenye Israel, unu gāsi kwa ya, Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, ezutewo ayi: ub͕u a kwa, biko, ka ayi je ije nke ubọchi atọ n’ọzara, ka ayi we chuara Jehova, bú Chineke-ayi, àjà.

19 Ma Mu onwem mara na eze Ijipt agaghi-ekwe unu je, é-è, ọ bughi n’aka di ike.

20 M’gēsetipu kwa akam, tib͕u Ijipt n’oké ọlum nile nke M’gālu n’etiti ya: emesi kwa o gēzilaga unu.

21 M’gēnye kwa ndi nka amara n’iru ndi Ijipt: o gēru kwa, mb͕e unu nāla, na unu agaghi-ab͕a aka la;

22 ma nwayi ọ bula gāriọta n’aka nwayi-ab͕ata-obi-ya, na n’aka nwayi nọ n’ulo-ya dika ọbìa, ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe-nb͕okwasi: unu gētiye kwa ha n’aru umu-unu ndikom na n’aru umu-unu ndinyom; unu gānapu kwa ndi Ijipt ihe-ha n’aka.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 4

1 Moses we za, si, Ma, le, ha agaghi-ekwem, ha agaghi-ege kwa nti n’olum: n’ihi na ha gāsi, Jehova emeghi ka i hu Ya anya.

2 Jehova we si ya, Gini bu ihe ahu di n’aka-gi? Ọ si, Nkpa-n’aka.

3 Ọ si, Tuda ya n’ala. Ọ we tuda ya n’ala, o we ghọ agwọ; Moses we b͕apu n’iru ya.

4 Jehova we si Moses, Setipu aka-gi, jide ya n’ọdùdù: (ọ we setipu aka-ya, jide ya, ọ we ghọ nkpa-n’aka-ya:)

5 ka ha we kwe na Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob, emewo gi ka i hu Ya.

6 Jehova si-kwa-ra ya ọzọ, Biko, tiye aka-gi n’obi-gi. Ọ we tiye aka-ya n’obi-ya: ọ we weputa ya, ma, le, aka-ya bu ekpenta, dika aku mmiri igwe.

7 Ọ we si, Tiyeghachi aka-gi n’obi-gi. (Ọ we tiyeghachi aka-ya n’obi-ya; ọ we weputa ya n’obi-ya, ma, le, ọ we dighachi ka anu-aru-ya.)

8 O gēru kwa, ma ọ buru na ha ekweghi gi, ọ buru kwa na ha egeghi nti n’ọlụ ihe-iriba-ama mbu, na ha gēkwe ọlụ ihe-iriba-ama nke ikpe-azu.

9 O gēru kwa, ma ọ buru na ha ekweghi kwa ihe-iriba-ama abua ndia, ọ buru kwa na ha egeghi nti n’olu-gi, na i gēwere ufọdu nime miri nke osimiri Nail, wusi ya n’ala-akọrọ: miri ahu nke i nēweputa n’osimiri Nail gāghọ kwa ọbara, ọ gāghọ ọbara n’ala-akọrọ.

10 Moses we si Jehova, Biko, Onye-nwe-ayi, Ọ bughi onye-ọ̀kà-okwu ka m’bu, ma-ọbu na mb͕e gara aga, ma-ọbu site na mb͕e I gwara orù-Gi okwu: n’ihi na onye ọnu-ya di arọ́, nke ire-ya di kwa arọ́, ka m’bu.

11 Jehova we si ya, Ònye tiyeworo ọnu madu nwere? ma-ọbu ònye nēme madu ka ọ buru onye-ob͕i, ma-ọbu onye nti chiri, ma-ọbu onye nāhu uzọ, ma-ọbu onye-ìsì? Ọ̀ bughi Mu onwem, bú Jehova?

12 Ma ub͕u a, je, Mu onwem gānọyere ọnu-gi, zí gi ihe i gēkwu.

13 Ma ọ siri, Biko, Onye-nwe-ayi, biko, zìe n’aka onye I gēziga.

14 Iwe Jehova we di ọku n’aru Moses, Ọ we si, Ọ̀ nọghi, bú Eron nwa-nne-gi, bú onye Livai? amawom na ya onwe-ya nēkwu okwu nke-ọma. Ọzọ kwa, le, ya onwe-ya nāputa izute gi: ma mb͕e ọ huru gi, ọ gāṅuri n’obi-ya.

15 I gāgwa kwa ya okwu, tiye okwu ndia n’ọnu-ya: Mu onwem gānọye-kwa-ra ọnu-gi, nọye-kwa-ra ọnu-ya, zí kwa unu ihe ahu unu gēme.

16 Ya onwe-ya gāgwara gi ndim okwu: ọ gēru kwa, na ya onwe-ya gāburu gi ọnu, gi onwe-gi gābu-kwa-ra ya Chineke.

17 Ọ bu kwa nkpa-n’aka nka ka i gēwere n’aka-gi, nke i gēji me ihe-iriba-ama ndia.

18 Moses we je, laghachikuru Jetro, bú nna nwunye-ya, si ya, Biko, ka m’je, laghachikuru umu-nnem ndi nọ n’Ijipt, hu ma ha nọ ndu ub͕u a. Jetro we si Moses, Je n’udo.

19 Jehova we si Moses nime Midian, Je, laghachi n’Ijipt: n’ihi na ndikom ahu nile ndi nāchọ ndu-gi anwuruwo.

20 Moses we chiri nwunye-ya na umu-ya ndikom, me ka inyinya-ibu buru ha, ọ we laghachi n’ala Ijipt: Moses we were nkpa-n’aka Chineke n’aka-ya.

21 Jehova we si Moses, Mb͕e i je ilaghachi n’Ijipt, le anya ka i me n’iru Fero ihe-ebube nile nke M’tiyere n’aka-gi: ma Mu onwem gēme ka obi-ya di ike, ọ gaghi-ezipu kwa ndim.

22 I gāsi kwa Fero, Otú a ka Jehova siri, Nwam, bú ọkparam, ka Israel bu:

23 M’we si gi, Zipu nwam, ka ọ we fèm; i we ju izipu ya: le, Mu onwem gaje ib͕u nwa-gi, bú ọkpara-gi.

24 O rue, n’uzọ n’ebe inọ ọnọdu-abali, na Jehova zutere ya, chọ ime ka ọ nwua.

25 Zipora we were ọ́mú, bipu api nwa-ya, me ka ọ metu ukwu abua nke di-ya; Zipora we si, N’ezie di nke ọbara ka i bu n’ebe m’nọ.

26 Ọ we rapu ya ndu. Mb͕e ahu Zipora siri, Di nke ọbara ka i bu, bayere obibì-úgwù.

27 Jehova we si Eron, Jerue ọzara izute Moses. Ọ we je, zute ya n’ugwu Chineke, sutu ya ọnú.

28 Moses we gosi Eron okwu nile nke Jehova, bú nke O zitere ya ka o kwue, na ihe-iriba-ama nile Ọ nyere ya iwu ka ọ me.

29 Moses na Eron we je chikọta ndi-okenye nile nke umu Israel:

30 Eron we kwue okwu nile nke Jehova gwara Moses, ọ me kwa ihe-iriba-ama nile n’anya ndi Israel.

31 Ndi ahu we kwere: mb͕e ha nuru na Jehova letarari umu Israel, na Ọ hu-kwa-rari nweda-n’ala nke ha, ha rube isi kpọ isi ala.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 5

1 Emesia Moses na Eron biara, si Fero, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, nāsi, Zipu ndim, ka ha we merem ememe n’ọzara.

2 Fero we si, Ònye bu Jehova, na m’gēge nti n’olu-Ya izipu Israel? amaghm Jehova, ọzọ kwa, m’gaghi-ezipu Israel.

3 Ha si, Chineke nke ndi-Hibru ezutewo ayi: biko, ka ayi je ije nke ubọchi atọ n’ọzara, chuara Jehova, bu Chineke-ayi, aja: ka Ọ we ghara iwere ajọ ọria nēfe efe, ma-ọbu mma-agha, zute ayi.

4 Eze Ijipt we si ha, N’ìhi gini ka unu, bú Moses na Eron, nēme ka ndi ahu rapu ọlu-ha nile? jenu ibu-unu.

5 Fero si-kwa-ra, Le, ọtutu ka ndi ala nka di ub͕u a, unu nēme kwa ka ha kwusi n’ibu ibu nile ha.

6 N’ubọ-chi ahu Fero we nye ndi nāchi ndi Israel n’ihe-ike na ndi nēle ha anya n’ọlu iwu, si,

7 Unu enye-kwa-la ndi ahu okporo-ọka ọzọ ikpu brick, dika na mb͕e gara aga: ha onwe-ha gēje chikọtara onwe-ha okporo-ọka.

8 Ọnu-ọgugu brick, nke ha onwe-ha nākpu na mb͕e gara aga, ka unu gātukwasi ha; unu agubìla ihe nime ya: n’ihi na ndi-ume-ngwu ka ha bu; n’ihi ya ka ha onwe-ha nēti nkpu, si, Ka ayi je, chuara Chineke-ayi àjà.

9 Ka òfùfè-ha di arọ́ n’aru ndikom ahu, ka ha we lua ọlu nime ya; ha ele-kwa-la okwu-ugha anya ọma.

10 Ndi nāchi ndi Israel n’ihe-ike we pua, ha na ndi nēle ha anya n’ọlu, ha we gwa ndi ahu okwu, si, Otú a ka Fero siri, M’gaghi-adi nēnye unu okporo-ọka.

11 Unu onwe-unu je, werenu okporo-ọka n’onwe-unu n’ebe ọ bula unu gāchọta ya, n’ihi na ọ dighi ihe agāgubì n’òfùfè-unu.

12 Ndi Israel we b͕asa n’ala Ijipt nile ichikọta ahihia-ọka n’ọnọdu okporo-ọka.

13 Ndi nāchi ha n’ihe-ike nēme ngwa, si, Luzeunu ọlu-unu, ọlu nke ubọchi n’ubọchi-ya, dika mb͕e okporo-ọka di.

14 Ewe tie ha ihe, bú ndi nēle umu Israel anya n’ọlu, nke ndi Fero ndi nāchi umu Israel n’ihe-ike doro isi-ha, ewe si ha, Gini mere unu aluzughi òkè-unu ma nyahuru ma ta, n’ikpu brick dika na mb͕e gara aga?

15 Ndi nēle umu Israel anya n’ọlu we bia tikue Fero, si, N’ìhi gini ka i nēme ndi-orù-gi otú a?

16 Ọ dighi okporo-ọka anēnye ndi-orù-gi, ma ha nāsi ayi, Kpuanu brick: le kwa, anēti ndi-orù-gi ihe; ma ndi nke gi emehiewo.

17 Ma ọ siri, Ndi-ume-ngwu ka unu bu, ndi-ume-ngwu ka unu bu: n’ihi nka ka unu onwe-unu nāsi, Ka ayi je, chuara Jehova àjà.

18 Ma ub͕u a, jenu, fè òfùfè; n’ihi na agaghi-enye unu okporo-ọka, ma ọnu-ọgugu brick-unu ka unu gēnye.

19 Ndi nēle umu Israel anya n’ọlu we hu ha na ha nọ n’ọnọdu ọjọ mb͕e anāsi, Unu agubìla ihe nime brick-unu, ọlu nke ubọchi n’ubọchi-ya.

20 Ha we zute Moses na Eron, ndi nēguzo onwe-ha izute ha, mb͕e ha si n’ebe Fero nọ puta:

21 ha si ha, Jehova lekwasi unu anya, kpe ikpe: n’ihi na unu emewo ka ísì-ayi sì ísì ọjọ n’anya Fero, na n’anya ndi-orù-ya, itiye mma-agha n’aka-ha ib͕u ayi.

22 Moses we laghachikuru Jehova, si, Onye-nwe-ayi, n’ìhi gini ka I mejọworo ndi nka? ọ̀ bu n’ihi gini bu nka na I zitewom?

23 Ma site na mb͕e m’biakutere Fero ikwu okwu n’aha-Gi, ọ mejọwo ndi nka; I naputaghi kwa ndi-Gi ma-ọli.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 6

1 Jehova we si Moses, Ub͕u a ka i gāhu ihe M’gēme Fero: n’ihi na n’aka di ike ka o gēzipu ha, ọ bu kwa n’aka di ike ka ọ gāchupu ha n’ala-ya.

2 Chineke we gwa Moses okwu, si ya, Mu onwem bu JEHOVA:

3 eme-kwa-ram Abraham, me kwa Aisak, me kwa Jekob, ka ha hum anya dika Chineke Nke puru ime ihe nile, ma n’aham, bú JEHOVA, ka anēmeghi ka ha maram.

4 Ọzọ kwa, emewom ka ọb͕ub͕a-ndum guzosie ike n’ebe ha nọ, inye ha ala Kenean, bú ala ọnọdu-ọbìa nile ha, nke ha nọri dika ọbìa nime ya.

5 Ọzọ kwa, Mu onwem anuwo isu-ude umu Israel, ndi ndi Ijipt nēme ka ha buru orù; echetawokwam ọb͕ub͕a-ndum.

6 N’ihi ya si umu Israel, Mu onwem bu Jehova, M’gēme kwa ka unu si n’okpuru ibu nile nke ndi Ijipt pua, M’gānaputa kwa unu n’òfùfè-ha, were kwa ogwe-aka esetiri eseti, were kwa ikpé uku di iche iche, b͕aputa unu:

7 M’gēwere kwa unu n’Onwem ka unu buru otù ndi, M’gābu-kwa-ra unu Chineke: unu gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova Chineke-unu, Nke nēme ka unu si n’okpuru ibu nile nke ndi Ijipt puta.

8 M’gēme kwa ka unu bata n’ala ahu, nke M’weliri akam iwere ya nye Abraham, nye kwa Aisak, nye kwa Jekob; M’gēnye kwa unu ya ka ọ buru ihe-nnweta: Mu onwem bu Jehova.

9 Moses we gwa umu Israel okwu otú a: ma ha egeghi Moses nti site n’enweghi-ntachi-obi nime mọ-ha, site kwa n’òfùfè siri ike.

10 Jehova we gwa Moses okwu, si,

11 Bà gwa Fero, bú eze Ijipt, okwu, ka ọ we zipu umu Israel n’ala-ya.

12 Moses we kwue n’iru Jehova, si, Le, umu Israel egeghm nti; Fèro gēsi kwa aṅa nuru olum, onye mu onwem bu onye anēbighi úgwù n’eb͕ub͕ere-ọnu?

13 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, nye ha iwu n’ebe umu Israel nọ, na n’ebe Fero eze Ijipt nọ, ime ka umu Israel si n’ala Ijipt pua.

14 Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha: umu-ndikom Reuben, bú ọkpara Israel; Hanok, na Palu, na Hezron, na Kami: ndia bu ab͕uru Reuben.

15 Umu-ndikom Simeon kwa; Jemuel, na Jamin, na Ohad, na Jakin, na Zoha, na Shaul, bú nwa nke nwayi Kenean ahu: ndia bu ab͕uru Simeon.

16 Ndia bu kwa aha umu-ndikom Livai, dika osuso-ọmumu nile ha si di; Giashon, na Kohat, na Merari: arọ ndu Livai di ọgu arọ isi na iri na asa.

17 Umu-ndikom Giashon; Libni, na Shimai, dika ab͕uru nile ha si di.

18 Umu-ndikom Kohat kwa; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel: arọ ndu Kohat di ọgu arọ isi na iri na atọ.

19 Umu-ndikom Merari kwa; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru ndi Livai, dika osuso-ọmumu nile ha si di.

20 Amram we lutara onwe-ya Jokebed na nwunye, bú nwa-nne-nwayi nke nna-ya; ọ we muara ya Eron na Moses: arọ ndu Amram di ọgu arọ isi na iri na asa.

21 Umu-ndikom Izha kwa; Kora, na Nefeg, na Zikri.

22 Umu-ndikom Uziel kwa; Mishael, na Elzafan, na Sitri.

23 Eron we lutara onwe-ya Elisheba na nwunye, bú nwa-nwayi Aminadab, nwa-nne-nwayi Nahshon; ọ we muara ya Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.

24 Umu-ndikom Kora kwa; Asia, na Elkena, na Abiasaf; ndia bu ab͕uru ndi Kora.

25 Eleeza nwa Eron we lutara onwe-ya otù nime umu-ndinyom Putiel, ọ we muara ya Finehas. Ndia bu ndi-isi nke ndi bu nna nke ndi Livai, dika ab͕uru nile ha si di.

26 Ndia bu Eron na Moses ahu, ndi Jehova siri, Menu ka umu Israel si n’ala Ijipt puta n’usu nile nke ndi-agha-ha.

27 Ha onwe-ha bu ndi nāgwa Fero eze Ijipt okwu, ime ka umu Israel si n’Ijipt pua: ndia bu Moses na Eron ahu.

28 O rue, n’ubọchi Jehova gwara Moses okwu n’ala Ijipt,

29 na Jehova gwara Moses okwu, si, Mu onwem bu Jehova: gwa Fero eze Ijipt okwu nile nke Mu onwem nāgwa gi.

30 Moses we si n’iru Jehova, Le, mu onwem bu onye anēbighi úgwù n’eb͕ub͕ere-ọnu, Fèro gēsi kwa aṅa gem nti?

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 7

1 Jehova we si Moses, Le, emewom i ka i ghọrọ Fero chi: Eron, bú nwa-nne-gi, gābu kwa onye-amuma-gi.

2 Gi onwe-gi gēkwu ihe nile nke M’nēnye gi n’iwu: Eron nwa-nne-gi gāgwa kwa Fero okwu, ka ọ we zipu umu Israel n’ala-ya.

3 Ma Mu onwem gēme ka obi Fero sie ike, M’gēme kwa ka ihe-iriba-amam na ihe-ebubem di ọtutu n’ala Ijipt.

4 Ma Fero agaghi-ege unu nti, M’gētiye kwa akam n’aru ndi Ijipt, were kwa ikpé uku di iche iche me ka usu nile nke ndi-agha nkem, bú ndim umu Israel, si n’ala Ijipt puta.

5 Ndi Ijipt gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M’gēseti akam n’aru ndi Ijipt, me ka umu Israel si n’etiti ha puta.

6 Moses na Eron we me ya; dika Jehova nyere ha iwu, otú a ka ha mere.

7 Moses b͕ara ọgu arọ anọ, Eron b͕a-kwa-ra ọgu arọ anọ na atọ, mb͕e ha gwara Fero okwu.

8 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,

9 Mb͕e Fero gāgwa unu okwu, si, Merenu onwe-unu ihe-ebube: i gāsi kwa Eron, Were nkpa-n’aka-gi, tuda ya n’iru Fero, ka ọ ghọ ogologo anu.

10 Moses na Eron we bakuru Fero, me otú a, dika Jehova nyere ha iwu: Eron we tuda nkpa-n’aka-ya n’iru Fero, na n’iru ndi-orù-ya, ọ we ghọ ogologo anu.

11 Fero we kpọ kwa ndi mara ihe, kpọ kwa ndi-mb͕asi: ha onwe-ha kwa, bú ndi-ode-akwukwọ di nsọ nke Ijipt, we were ihe-nzuzo di iche iche ha me otú a.

12 Ha we tuda, nwoke ọ bula nkpa-n’aka-ya, ha we ghọ ogologo anu: ma nkpa-n’aka Eron lodara nkpa-n’aka-ha.

13 Obi Fero we di ike, Ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru.

14 Jehova we si Moses, Obi Fero di arọ́, ọ nāju izipu ndim.

15 Jekuru Fero n’ututu; le, ọ nāpu ije miri; i gēguzo onwe-gi n’usọ osimiri Nail izute ya; nkpa-n’aka ahu kwa nke b͕anwere ghọ agwọ, i gēwere ya n’aka-gi.

16 I gāsi kwa ya, Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, O zìwom biakute gi, si, Zipu ndim, ka ha we fèm n’ọzara: ma, le, i nughi rue ub͕u a.

17 Otú a ka Jehova siri, Nime nka ka i gāmara na Mu onwem bu Jehova: le, mu onwem gaje iwere nkpa-n’aka nke di n’akam tikwasi miri nke di n’osimiri Nail, ọ gāb͕anwe ghọ ọbara.

18 Azù nke di n’osimiri Nail gānwu, osimiri Nail gēsì kwa ísì; ndi Ijipt gāsọ iṅu miri si n’osimiri Nail puta oyi.

19 Jehova we si Moses, Si Eron, Were nkpa-n’aka-gi setipu aka-gi n’elu miri nile nke Ijipt, n’elu osimiri nile ha, na n’elu osimiri Nail nile ha, na n’elu ọdọ-miri nile ha, na n’elu ebe-nchikọta-miri-ha nile, ka ha we ghọ ọbara; ọbara gādi kwa n’ala Ijipt nile, ma n’ihe nke osisi ma n’ihe nke nkume.

20 Moses na Eron we me otú a, dika Jehova nyere iwu; ọ we welie nkpa-n’aka ahu tie miri nke di n’osimiri Nail, n’anya Fero, na n’anya ndi-orù-ya; miri nile nke di n’osimiri Nail we b͕anwe ghọ ọbara.

21 Azù nke di n’osimiri Nail we nwua; osimiri Nail nēsì kwa ísì, ndi Ijipt apughi kwa iṅu miri si n’osimiri Nail puta; ọbara ahu we di n’ala Ijipt nile.

22 Ndi-ode-akwukwọ di nsọ nke Ijipt we were ihe-nzuzo di iche iche ha me otú a: obi Fero we di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru.

23 Fero we chigharia, ba n’ulo-ya, ma o tiyeghi obi-ya ọbuná na nka.

24 Ndi Ijipt nile we gwue olùlù buruburu osimiri Nail inwe miri-ọṅuṅu; n’ihi na ha apughi iṅu miri osimiri Nail.

25 Ubọchi asa we zue, ka Jehova tisiri osimiri Nail ihe.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 8

1 Jehova we si Moses, Bakuru Fero, si ya, Otú a ka Jehova siri, Zipu ndim, ka ha we fèm.

2 Ma o buru na gi onwe-gi aju izipu ha, le, Mu onwem gaje iwere awọ tie ókè-ala-gi nile:

3 osimiri Nail gēnuputa awọ, nke gārigo ba n’ulo-gi, na n’ime-ulo-ndina-gi, na n’elu ihe-ndina-gi, na n’ulo ndi-orù-gi, na n’aru ndi-gi, na n’ite-ọku-gi nile, na n’ihe-gi i ji agwọ achicha:

4 ọ bu kwa n’aru gi, na n’aru ndi-gi, na n’aru ndi-orù-gi nile, ka awọ ahu gārigo.

5 Jehova we si Moses, Si Eron, Setipu aka-gi, ya na nkpa-n’aka-gi, n’elu osimiri nile, na n’elu osimiri Nail nile, na n’elu ọdọ-miri nile, me ka awọ rigota n’ala Ijipt.

6 Eron we setipu aka-ya n’elu miri nile nke Ijipt; awọ we rigo, kpuchie ala Ijipt.

7 Ndi-ode-akwukwọ di nsọ we were ihe-nzuzo-ha di iche iche me otú a, we me ka awọ rigo n’elu ala Ijipt.

8 Fero we kpọ Moses na Eron, si, Riọnu Jehova, ka O wezuga awọ n’ebe m’nọ, na n’ebe ndim nọ; m’gēzipu kwa ndi Israel, ka ha we chuara Jehova àjà.

9 Moses we si Fero, Nya isi n’arum: òle mb͕e ka m’gāriọrọ gi aririọ, riọ-kwa-ra ndi-orù-gi, riọ-kwa-ra ndi-gi, ka ekpochapu awọ n’ebe i nọ na n’ebe ulo-gi nile di? nání n’osimiri Nail ka ha gāfọdu.

10 Ọ si, Echi. Ọ si, Ya di ka okwu-gi si di: ka i we mara na ọ dighi onye di ka Jehova, bú Chineke-ayi.

11 Awọ gēwezuga onwe-ha n’ebe i nọ, na n’ebe ulo-gi nile di, na n’ebe ndi-orù-gi nọ, na n’ebe ndi-gi nọ; nání n’osimiri Nail ka ha gāfọdu.

12 Moses na Eron we si n’ebe Fero nọ pua: Moses we tikue Jehova ntiku bayere okwu awọ nke O dorori nye Fero.

13 Jehova we me dika okwu Moses si di; awọ we nwupu n’ulo nile, na n’ogige nile, na n’ubi nile.

14 Ha we chikọba ha n’obo n’obo: ala ahu we nēsì ísì.

15 Fero we hu na o bìwo, o we me ka obi-ya di arọ́, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru.

16 Jehova we si Moses, Si Eron, Setipu nkpa-n’aka-gi, tie ájá nke ala, ọ gāghọ kwa anwu ntà n’ala Ijipt nile.

17 Ha we me otú a; Eron we setipu aka-ya, ya na nkpa-n’aka-ya. tie ájá nke ala, anwu ntà ahu we di n’aru madu, na n’aru anumanu; ájá nile nke ala ghọrọ anwu ntà n’ala Ijipt nile.

18 Ndi-ode-akwukwọ di nsọ we were ihe-nzuzo-ha di iche iche me otú a, ime ka anwu ntà puta, ma ha apugh: anwu ntà ahu we di n’aru madu, na n’aru anumanu.

19 Ndi-ode-akwukwọ di nsọ we si Fero, Nkpisi-aka Chineke ka nka bu: obi Fero we di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru.

20 Jehova we si Moses, Bilie n’isi-ututu, guzo onwe-gi n’iru Fero; le, ọ nāputa ije miri; i gāsi kwa ya, Otú a ka Jehova siri, Zipu ndim, ka ha we fèm.

21 N’ihi na, ma ọ buru na i dighi-ezipu ndim, le, M’gaje izite n’aru gi, na n’aru ndi-orù-gi, na n’aru ndi-gi, na nime ulo-gi nile, odudu: ulo nile nke ndi Ijipt gēju kwa n’odudu ahu, ya na ala nke ha di n’elu ya.

22 M’gēkewapu n’ubọchi ahu ala Goshen, nke ndim nēguzo n’elu ya, ya mere odudu agaghi-adi n’ebe ahu; ka i we mara na Mu onwem bu Jehova n’etiti uwa.

23 M’gētiye kwa nb͕aputa n’etiti ndim na ndi-gi: echi ka ihe-iriba-ama nka gādi.

24 Jehova we me otú a; odudu nke bara uba nke-uku we ba n’ulo Fero na ulo ndi-orù-ya: ọ bu kwa n’ala Ijipt nile ka ebibiri ala ahu n’ihi odudu.

25 Fero we kpọ Moses na Eron, si, Jenu, chuara Chineke-unu àjà n’ala nka.

26 Moses we si, O kwesighi ime otú a; n’ihi na ihe-árú ndi Ijipt ka ayi gēji chuara Jehova, bú Chineke-ayi, aja: le, àyi gēwere ihe-árú ndi Ijipt chu àjà n’anya-ha, ha agaghi-atub͕u kwa ayi na nkume?

27 Ije nke ubọchi atọ ka ayi gēje n’ọzara, chu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-ayi, àjà, dika Ọ nāsi ayi me.

28 Fero we si, Mu onwem gēzipu unu, ka unu we chuara Jehova, bú Chineke-unu, àjà n’ọzara; ọ bu nání na unu agaghi-eje ebe di anya nke-uku: riọrọnum aririọ.

29 Moses we si, Le, Mu onwem nēsi n’ebe i nọ pua, m’gāriọ kwa Jehova ka odudu we wezuga onwe-ha n’ebe Fero nọ, na n’ebe ndi-orù-ya nọ, na n’ebe ndi-ya nọ, echi: ma ka Fero ghara ikwa emò ọzọ, n’ighara izipu ndi Israel ichuru Jehova àjà.

30 Moses we si n’ebe Fero nọ pua, we riọ Jehova.

31 Jehova we me dika okwu Moses si di; O we wezuga odudu n’ebe Fero nọ, na n’ebe ndi-orù-ya nọ, na n’ebe ndi-ya nọ; ọ dighi otù fọduru.

32 Fero we me kwa ka obi-ya di arọ́ na mb͕e ahu, o zipughi kwa ndi Israel.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 9

1 Jehova we si Moses, Bakuru Fero, gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Zipu ndim, ka ha we fèm.

2 N’ihi na, ma ọ buru na gi onwe-gi nāju izipu ha, ma i nējigide ha,

3 le, aka Jehova di n’aru anu-ulo-gi nke di n’ọhia, n’aru inyinya-gi nile, na n’aru inyinya-ibu-gi nile, na n’aru camel-gi nile, na n’aru ìgwè ehi-gi, na n’aru ìgwè ewu na aturu-gi: ajọ ọria nke nēfe efe, nke di arọ́ nke-uku, gādi.

4 Jehova gākpa ókè n’etiti anu-ulo Israel na anu-ulo Ijipt: ọ dighi ihe gānwupu n’ihe nile umu Israel nwere.

5 Jehova we debe mb͕e akara àkà, si, Echi ka Jehova gēme ihe a n’ala nka.

6 Jehova we me ihe ahu n’echi-ya, anu-ulo Ijipt nile we nwua: ma nime anu-ulo umu Israel ọ dighi otù nwupuru.

7 Fero we ziga, ma, le, ọ dighi ma ọbuná otù nwupuru nime anu-ulo Israel. Obi Fero we di arọ́, o zipughi kwa ndi Israel.

8 Jehova we si Moses na Eron, Kporonu n’onwe-unu ntu oké ọku nju aka abua, ka Moses wu kwa ya n’iru elu-igwe n’anya Fero.

9 Ọ gāghọ uzuzu ntà n’elu ala Ijipt nile, ọ gāghọ kwa etuto nāb͕apú nb͕apú n’aru madu na n’aru anumanu, n’ala Ijipt nile.

10 Ha we kporo ntu oké ọku, guzo n’iru Fero; Moses we wua ya n’iru elu-igwe; o we ghọ ihe etuto nāb͕apú nb͕apú n’aru madu na n’aru anumanu.

11 Ndi-ode-akwukwọ di nsọ apughi kwa iguzo n’iru Moses, n’ihi ihe-ofifi ahu; n’ihi na ihe-etuto ahu di n’aru ndi-ode-akwukwọ di nsọ, na n’aru ndi Ijipt nile.

12 Jehova we me ka obi Fero di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova gwara Moses.

13 Jehova we si Moses, Bilie n’isi-ututu, guzo onwe-gi n’iru Fero, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Zipu ndim, ka ha we fèm.

14 N’ihi na ọ bu na mb͕e a ka Mu gaje izite ihe-otitim nile n’obi-gi, na n’aru ndi-orù-gi, na n’aru ndi-gi; ka i we mara na ọ dighi onye di kam n’uwa nile.

15 N’ihi na ub͕u a M’gēsetipuwori akam, were ajọ ọria nēfe efe tib͕u gi na ndi-gi, ewe zopu gi n’uwa:

16 ma otú ọ di ọ bu n’ihi nka ka M’guzoworo gi, ka M’we me ka i hu ikem, ka ewe kọ kwa akukọ aham n’uwa nile.

17 Ì nọ nātuli onwe-gi elu dika obo-ihe imegide ndim rue ub͕u a, na i gaghi-ezipu ha?

18 Le, dika mb͕e a echi M’gaje ime ákú-miri-ígwé di arọ́ nke-uku ka o zo, nke ákú-miri-ígwé dika ya nādighi n’Ijipt site n’ubọchi atọrọ ntọ-ala-ya we rue ub͕u a.

19 Ma ub͕u a, ziga, me anu-ulo-gi na ndi nile i nwere n’ọhia ka ha laghachi n’ulo ọsọsọ; madu ọ bula na anumanu ọ bula nke agāhu n’ọhia, nke agaghi-achikọta ha n’ulo, ákú-miri-ígwé ahu gādakwasi ha, ha we nwua.

20 Onye nātu egwu okwu Jehova n’etiti ndi-orù Fero mere ndi-orù-ya na anu-ulo-ya ka ha b͕aghachi n’ulo:

21 ma onye nētiyeghi obi-ya n’okwu Jehova rapuru ndi-orù-ya na anu-ulo-ya n’ọhia.

22 Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n’iru elu-igwe, ka ákú-miri-ígwé we di n’ala Ijipt nile, n’aru madu, na n’aru anumanu, na n’aru ihe-ọkukú ọ bula nke ubi, n’ala Ijipt.

23 Moses we setipu nkpa-n’aka-ya n’iru elu-igwe: Jehova we nye éb͕è-elu-igwe na ákú-miri-ígwé, ọku we nējeru ala; Jehova we me ka ákú-miri-ígwé zokwasi ala Ijipt.

24 Ákú-miri-ígwé we di, ọku nānwude kwa onwe-ya n’etiti ákú-miri-ígwé ahu, di arọ́ nke-uku, nke ihe dika ya nādighi n’ala Ijipt nile site na mb͕e ọ ghọrọ mba.

25 Ákú-miri-ígwé ahu we tib͕ue ihe nile nke di n’ọhia, ma madu ma anumanu, n’ala Ijipt nile; ọ bu kwa ihe-ọkukú nile ọ bula nke ubi ka ákú-miri-ígwé ahu tiri, ọ bu kwa osisi nile ọ bula nke ọhia ka o tipiara.

26 Nání n’ala Goshen, ebe umu Israel nọ, ka ákú-miri-ígwé nādighi.

27 Fero we zìe, kpọ Moses na Eron, si ha, Emehiewom ub͕u a: Jehova bu onye ezi omume, ma mu onwem na ndim bu ndi nēmebi iwu.

28 Riọnu Jehova; n’ihi na o zuwo, bú olu Chineke na ákú-miri-ígwé ndia; m’gēzipu kwa unu, unu agaghi-eguzo kwa ọzọ.

29 Moses we si ya, Mb͕e m’si n’obodo pua, M’gāb͕asara Jehova ọbu-akam abua; éb͕è-elu-igwe nile gākwusi, ákú-miri-ígwé agaghi-adi kwa ọzọ; ka i we mara na Jehova nwe uwa.

30 Ma gi onwe-gi na ndi-orù-gi, amawom na unu akātughi egwu iru Jehova, bú Chineke.

31 Eti-kwa-ra flax na ọka barley: n’ihi na ọka barley nāra oko, flax nāma ifuru.

32 Ma etighi ọka wheat na ọka spelt: n’ihi na ihe ahu etoghi.

33 Moses we si n’ebe Fero nọ, si n’obodo, pua, ọ we b͕asara Jehova ọbu-aka-ya abua: éb͕è-elu-igwe nile na ákú-miri-ígwé we kwusi, awusighi miri-ozuzo n’ala.

34 Fero we hu na miri-ozuzo na ákú-miri-ígwé na éb͕è-elu-igwe kwusiri, ọ we mehie ọzọ, me ka obi-ya di arọ́, ya na ndi-orù-ya.

35 Ewe me ka obi Fero di ike, o zipughi kwa umu Israel; dika Jehova kwuru site n’aka Moses.

Categories
ỌPUPU

ỌPUPU 10

1 Jehova we si Moses, Bakuru Fero: n’ihi na Mu onwem emewo ka obi-ya na obi ndi-orù-ya di arọ́, ka M’we tiye ihe-iriba-ama ndia n’etiti ha:

2 ka i we kọ kwa na nti nwa-gi na nwa nwa-gi akukọ bayere emò M’kwara ndi Ijipt, na ihe-iriba-ama nile nke M’tiyere n’etiti ha; ka unu we mara na Mu onwem bu Jehova.

3 Moses na Eron we bakuru Fero, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Rùe ole mb͕e i gāju iweda onwe-gi n’ala n’irum? zipu ndim, ka ha we fèm.

4 N’ihi na, ma ọ buru na i nāju izipu ndim, le, echi ka M’gaje ime ka igurube bata n’ókè-ala-gi:

5 ha gēkpuchi kwa iru ala, madu agaghi-enwe kwa ike ihu ala anya: ha gēri kwa ihe fọduru nke ihe arapuworo, nke fọduru unu site n’ákú-miri-ígwé, ha gēri kwa osisi nile ọ bula nke nēpuru unu epú site n’ọhia:

6 ulo-gi nile na ulo ndi-orù-gi nile na ulo ndi Ijipt nile gējuputa kwa; nke nna-gi-hà na nna nile nke nna-gi-hà nāhughi, site n’ubọchi ha nọ n’elu ala rue ta. Ọ we chigharia, si n’ebe Fero nọ pua.

7 Ndi-orù Fero we si ya, Rùe ole mb͕e ka nwoke a gāburu ayi ọnyà? zipu ndikom ahu, ka ha we fè Jehova, bú Chineke-ha: ì kāmaghi na Ijipt alawo n’iyì?

8 Ewe me ka Moses na Eron biaghachikute Fero: ọ si ha, Jenu, fè Jehova, bú Chineke-unu: ònye na onye bu ndi nēje?

9 Moses we si, Ayi na umu ntà ayi na ndi-agadi-ayi gāyikọ je, ayi na umu-ayi ndikom na umu-ayi ndinyom na ìgwè ewu na aturu-ayi na ìgwè ehi-ayi gāyikọ je; n’ihi na ememe Jehova ka ayi nwere.

10 Ọ si ha, Ka Jehova diyere unu otú a, dika m’gēzipu unu na umu-ntakiri-unu: lenu anya, n’ihi na ihe ọjọ di n’iru unu.

11 Ọ gaghi-ndi otú a: biko, jenu, unu, bú ndikom, fè Jehova; n’ihi na nke ahu ka unu onwe-unu nāchọ. Ewe chupu ha n’iru Fero.

12 Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n’elu ala Ijipt iweta igurube, ka ha we rigota n’elu ala Ijipt, rie-ihe-ọkukú ọ bula nke ala, bú ihe nile nke ákú-miri-ígwé ahu rapuru.

13 Moses we setipu nkpa-n’aka-ya n’elu ala Ijipt, Jehova we dubata ifufe Iru-anyanwu n’ala ahu ehihie ahu nile na abali ahu nile: mb͕e o ruru ututu ifufe Iru-anyanwu ahu butere igurube.

14 Igurube we rigota n’elu ala Ijipt nile, be n’ókè-ala ọ bula nke Ijipt: ha di arọ́ nke-uku; tutu ha ọ dighi igurube di otú a, dika igurube ahu, mb͕e ha gasiri ọ gaghi-adi kwa igurube otú a.

15 Ha we kpuchie iru ala ahu nile, ala we b͕a ọchichiri; ha we rie ihe-ọkukú nile ọ bula nke ala ahu, na nkpuru nile nke osisi nke ákú-miri-ígwé rapuru: ọ dighi kwa akwukwọ ndu fọduru, n’osisi ma-ọbu n’ihe-ọkukú nke ubi, n’ala Ijipt nile.

16 Fero we me ngwa ikpọ Moses na Eron, si, Eme-hiewom megide Jehova, bú Chineke-unu, megide kwa unu.

17 Ma ub͕u a, biko, gbaghara nmehiem nání otù ub͕ò a, riọ-kwa-nu Jehova, bú Chineke-unu, ka Ọ we wezuga n’arum nání ọnwu a.

18 Ọ we si n’ebe Fero nọ pua, riọ Jehova aririọ.

19 Jehova we me ifufe Ọdida-anyanwu di ike nke-uku ka o chigharia, nke buru igurube, fere ha ga n’Oké Osimiri Uhie; ọ dighi otù igurube fọduru n’ókè-ala ọ bula nke Ijipt.

20 Ma Jehova mere ka obi Fero di ike, o zipughi kwa umu Israel.

21 Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n’iru elu-igwe, ka ọchichiri we b͕a n’elu ala Ijipt, bú ọchichiri agēbitu aka.

22 Moses we setipu aka-ya n’iru elu-igwe; oké ọchichiri we di n’ala Ijipt nile ubọchi atọ;

23 ha ahuritaghi ibe-ha anya, ọ dighi kwa onye si n’ebe ọ nọ bilie ubọchi atọ: ma umu Israel nile nwere ìhè n’ebe-obibi nile ha.

24 Fero we kpọ Moses, si, Jenu, fè Jehova; nání ìgwè ewu na aturu-unu na ìgwè ehi-unu ka agēdebe: ka umu-ntakiri-unu so kwa unu je.

25 Moses we si, Gi onwe-gi gēnye kwa n’aka-ayi ihe àjà, na ihe àjà-nsure-ọku, ka ayi we mere Jehova, bú Chineke-ayi, ihe.

26 Ọzọ kwa, anu-ulo-ayi gēso ayi je; agaghi-arapu otù ukwu anu; n’ihi na ufọdu nime ha ka ayi gēwere fè Jehova, bú Chineke-ayi; ma ayi onwe-ayi amaghi ihe ayi gēji fè Jehova, rue mb͕e ayi gābia rue ebe ahu.

27 Ma Jehova mere ka obi Fero di ike, o kweghi kwa izipu ha.

28 Fero we si ya, Pua n’arum la, lezie onwe-gi anya, ahula irum ọzọ; n’ihi na n’ubọchi i huru irum ka i gānwu.

29 Moses we si, Nke-ọma ka i kwuworo; m’gaghi-ahu kwa iru-gi ọzọ.