Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 31

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Bọrọ umu Israel ọ́bọ̀ n’aru ndi Mdian: emesia agāchikọta gi na umu-nna-gi n’ala-mọ.

3 Moses we gwa ndi Israel okwu, si, Sinu n’etiti onwe-unu jikere n’onwe-unu ndikom isoro usu-ndi-agha, ka ha we megide Midian, ibọkwasi Midian ọ́bọ̀ Jehova.

4 Nnù ndikom abua na ọgu iri n’ebo n’ebo, n’ebo nile nke Israel, ka unu gēzigara usu-ndi-gha ahu.

5 Ewe si n’usu nnù abua na ọgu iri nile nke Israel rara nnù ndikom abua na ọgu iri nke ebo ọ bula nye, orú nnù na nnù iri ejikere iso usu-ndi-agha ahu.

6 Moses we ziga ha, nnù ndikom abua na ọgu iri nke ebo ọ bula, isoro usu-ndi-agha, ha na Finehas nwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, isoro usu-ndi-agha, ihe nile nke ebe nsọ Chineke na opì abua ọ gāfù idasi uda ike di kwa n’aka-ya.

7 Ha we buso Midian agha, dika Jehova nyere Moses iwu; ha we b͕ue nwoke nile ọ bula.

8 Ndi-eze Midian ka ha b͕u-kwa-ra, tiyere ndi-ha eb͕uru eb͕u; bú Evi, na Rekem, na Zua, na Hua, na Reba, eze ise Midian: ha were kwa mma-agha b͕ue Belam nwa Beoa.

9 Umu Israel we dọta ndinyom Midian na umu-ntakiri-ha n’agha; ọ bu kwa anu-ulo-ha nile, na anumanu-ha nile, na àkù-ha nile, ka ha lutara n’agha.

10 Ha sure-kwa-ra obodo-ha nile n’ebe-obibi nile ha, na ebe-ulo-ikwū-ha nile, n’ọku.

11 Ha we chiri ihe nile akwatara n’agha, na ihe-nweta nile, ma n’etiti madu ma n’etiti anumanu.

12 Ha we wetara Moses, weta-kwa-ra Eleeza, bú onye-nchu-àjà, weta-kwa-ra nzukọ umu Israel, ndi adọtara n’agha, na ihe-nweta, na ihe akwatara n’agha, rue ọmuma-ulo-ikwū, rue ala ihe nādighi nke Moab nke di n’akuku Jọdan na nso Jeriko.

13 Moses, na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na ndi-isi nile nke nzukọ Israel, we pua izute ha n’azu ọmuma-ulo-ikwū.

14 Moses we wesa ndi-nlekọta usu-ndi-agha ahu iwe, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, ndi nēsi n’usu-ndi-agha nke agha ahu bia.

15 Moss we si ha, Ùnu emewo ka ndinyom nile di ndu?

16 Le, ndia buru umu Israel, n’okwu-ọnu Belam, ihe nēweta nmekpu megide Jehova n’okwu Peoa, ihe-otiti ahu we di n’etiti nzukọ Jehova.

17 Ma ub͕u a b͕uenu nwoke ọ bula n’etiti umu-ntakiri, ọ bu kwa nwayi ọ bula nke mara nwoke site na ndina nwoke ka unu gēb͕u.

18 Ma umu-ntakiri nile n’etiti ndinyom, ndi nāmaghi ndina nwoke, menu ka ha diri unu ndu.

19 Ma unu onwe-unu, manu ulo-kwū-unu n’azu ọmuma-ulo-ikwū ubọchi asa: onye ọ bula nke b͕uworo madu, na onye ọ bula nke metuworo onye eb͕uru eb͕u aru, wepunu nmehie n’aru-unu n’ubọchi nke-atọ na n’ubọchi nke-asa, unu onwe-unu na ndi unu dọtaworo n’agha.

20 Ma uwe ọ bula, na ihe akpukpọ ọ bula, na ihe ọ bula eji aji ewu me, na ihe osisi ọ bula, unu gēwepu nmehie bayere ha n’aru-unu.

21 Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we si ndikom nke usu-ndi-agha ahu ndi nābà n’agha ahu, Nka bu ukpuru iwu ahu nke Jehova nyere Moses n’iwu:

22 otú ọ di, ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla, na ígwè, na b͕amb͕am, na opù,

23 bú ihe ọ bula nke gānagide ọku, unu gēme ka ọ gabiga n’ọku ọ gādi kwa ọcha; nání, agēwere miri nke idi-na-nsọ wepu nmehie-ya: ma ihe ọ bula nke nāgaghi-anagide ọku, unu gēme ka ọ gabiga nime miri.

24 Unu gāsu kwa uwe-unu n’ubọchi nke-asa, unu gādi kwa ọcha, emesia unu gābata n’ọmuma-ulo-ikwū.

25 Jehova we gwa Moses okwu, si,

26 Guta ọnu-ọgugu ihe-nweta, bú nke adọtara n’agha, ma n’etiti madu ma n’etiti anu-ulo, gi onwe-gi, na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na ndi-isi nke ndi bu nna nzukọ a:

27 kera ihe-nweta ahu; n’etiti ndi nēbu agha, bú ndi nāpukuru usu-ndi-agha, na nzukọm nile:

28 unu gānara kwa n’aka ndi-agha ahu, bú ndi nāpukuru usu-ndi-agha ahu, útù ibuliri Jehova: otù nkpuru-obi nime nnù nkpuru-obi na ọgu ise, nime madu, na nime ìgwè ehi, na nime inyinya-ibu, na nime ìgwè ewu na aturu;

29 na nkera-ha ka unu gānara ya, nye ya Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ọ bu àjà-nbuli Jehova

30 Na nkera nke umu Israel ka i gānara kwa otù ihe anaputara n’ọgu ihe abua na iri, nime madu, na nime ìgwè ehi, na nime inyinya-ibu, na nime ìgwè ewu na aturu, bú nime anu-ulo nile, i gēnye kwa ha ndi Livai, bú ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe-obibi Jehova.

31 Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we me dika Jehova nyere Moses iwu.

32 Ma ihe-nweta ahu, bú ihe fọduru n’ihe-nluta nke ndi usu-ndi agha lutara n’agha, bu orú nnù aturu ọgu uzọ anọ na uzọ anọ, na nnù asa, na ọgu iri,

33 ehi di kwa orú nnù uzọ iteghete;

34 inyinya-ibu di kwa orú nnù uzọ asa, na nnù iri-na-abua, na ọgu iri;

35 madu kwa, bú ndinyom ndi nāmaghi ndina nwoke, madu nile di orú nnù uzọ anọ.

36 Nkera ahu, nke bu òkè nke ndi nāpu ba n’usu-ndi-agha, we di n’ọnu-ọgugu ìgwè ewu na aturu orú nnù ọgu uzọ abua na uzọ abua, na nnù atọ, na ọgu iri-na-ise:

37 útù atùru Jehova, nke sitere n’ìgwè ewu na aturu, we di nnù na ọgu iri-na-atọ, na iri na ise.

38 Ehi di kwa orú nnù uzọ anọ na nnù iri; utu aturu Jehova site na ha we di ọgu atọ na iri na abua.

39 Inyinya-ibu di kwa orú nnù uzọ atọ, na nnù iri-na-isi, na ọgu ise; utu-ha aturu Jehova we di ọgu atọ na otù.

40 Madu di kwa orú nnù uzọ abua; utu aturu Jehova site na ha we di orú madu na iri na abua.

41 Moses we nye Eleeza, bú onye-nchu-àjà, utu ahu, nke bu àjà-nbuli Jehova, dika Jehova nyere Moses iwu.

42 Moses we nara na nkera nke umu Israel, nke Moses kerara site na ihe ndikom nēbu agha,

43 (ma nkera nke nzukọ Israel, nke sitere n’ìgwè ewu na aturu, di orú nnù ọgu uzọ abua na uzọ abua, na nnù atọ, na ọgu iri-na-ise,

44 ìgwè ehi di orú nnù uzọ anọ, na nnù iri,

45 inyinya-ibu di orú nnù uzọ atọ, na nnù iri-na-isi, na ọgu ise,

46 madu di orú nnù uzọ abua;)

47 Moses we nara na nkera nke umu Israel otù ihe anaputara n’ọgu ihe abua na iri, nime madu, na nime anu-ulo, ọ we nye ha ndi Livai, bú ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe-obibi Jehova; dika Jehova nyere Moses iwu.

48 Ndi-nlekọta ndi nēlekọta usu nile nke nnù ndikom nke usu-ndi-agha abua na ọgu iri, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, we bia nso Moses:

49 ha si Moses, Ndi-orù-gi agutawo ọnu-ọgugu ndi-agha nke di n’aka-ayi, ma ọ dighi otù nwoke puru na ngukọta-ayi.

50 Ayi ewetawo kwa nso ihe iji biaru nso Jehova, ihe nwoke ọ bula chọtaworo, ihe ọla-edo, bú iyab͕a-ukwu, na ọla-aka, na nb͕a-aka-akàrà, na nb͕a-aka-nti, na ihe anēyi n’olu, ikpuchiri nkpuru-obi-ayi nmehie-ha n’iru Jehova.

51 Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we nara ha ọla-edo ahu, bú ihe nile akpuru akpu.

52 Ọla-edo nile nke àjà-nbuli ahu nke ha buliri Jehova we di orú nnù shekel uzọ abua, na nnù, na ọgu iri na asa, na iri, bú nke sitere n’aka ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na n’aka ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise.

53 (N’ihi na ndikom nke usu-ndi-agha ahu lutara ihe n’agha, nwoke ọ bula ọ lutara n’onwe-ya.)

54 Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we nara ọla-edo ahu n’aka ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na nke usu nile nke ọgu ndikom ise, webata ha n’ulo-ikwū nzute, iburu umu Israel ihe-ncheta n’iru Jehova.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 32

1 Ma umu Reuben na umu Gad nwere ọtutu anu-ulo, ha riri nne nke-uku: ha we hu ala Jeza, na ala Gilead, ma, le, ebe ahu bu ebe anu-ulo;

2 umu Gad na umu Reuben we bia, gwa Moses, gwa kwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, gwa kwa ndi-isi nzukọ Israel, okwu, si,

3 Atarot, na Dibon, na Jeza, na Nimra, na Heshbon, na Eleale, na Seban, na Nebo, na Beon,

4 bú ala nke Jehova tib͕uru n’iru nzukọ Israel, ala anu-ulo ka ọ bu, ma ndi-orù-gi nwere anu-ulo.

5 Ha si kwa, Ọ buru na ayi ahutawo amara n’iru gi, ka enye ndi-orù-gi ala nka ibu ihe-onwunwe; emela ka ayi gabiga Jọdan.

6 Moses we si umu Gad na umu Reuben, Umu-nne-unu, hà gābà n’agha ahu, unu onwe-unu ewe nọdu n’ebe a?

7 Ọ̀ bu kwa n’ihi gini ka unu nēme ka obi umu Israel ju igabiga ba n’ala ahu Jehova nyeworo ha?

8 Otú a ka nna-unu-hà mere, mb͕e m’siri n’ala Kedesh-banea ziga ha ihu ala ahu.

9 Ha we rigorue ndagwurugwu Eshkol, hu ala ahu, we me ka obi umu Israel si, É-è, si na ha agaghi-abà n’ala ahu nke Jehova nyere ha-ri.

10 Iwe Jehova we di ọku n’ubọchi ahu, Ọ we ṅua iyi, si,

11 Ndikom ahu ndi nēsi n’ala Ijipt rigoputa, site n’onye b͕ara orú arọ we gaba n’iru, ha agaghi-ahu ala ahu ma-ọli nke M’ṅuru Abraham, ṅu-kwa-ra Aisak, ṅu-kwa-ra Jekob, iyi inye ha; n’ihi na ha esozughm n’azu:

12 ma ọ bu nání Keleb nwa Jefune, bú onye Kenizait, na Joshua nwa Nun: n’ihi na ha esozuwo Jehova n’azu.

13 Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we me ka ha nāṅaghari n’ọzara ọgu arọ abua, rue mb͕e ọb͕ọ ahu nile, nke nēme ihe ọjọ n’anya Jehova, gwusiri.

14 Ma, le, unu ebiliwo n’ọnọdu nna-unu-hà, nmuba nke ndikom, bú ndi-nmehie, iwere idi-ọku ọzọ tukwasi n’idi-ọku iwe Jehova megide Israel.

15 Mb͕e unu gēsi n’iso Ya n’azu laghachi, Ọ gārapu kwa ha n’ọzara nka; unu gēbibi kwa ndi nka nile.

16 Ha we biakute ya nso, si, Ogige ìgwé ewu na aturu ka ayi gēwuru anu-ulo-ayi n’ebe a, wu-kwa-ra umu-ntakiri-ayi obodo:

17 ma ayi onwe-ayi gējikere onwe-ayi je ọsọsọ n’iru umu Israel, rue mb͕e ayi gēme ka ha ba n’ebe-ha: ma umu-ntakiri-ayi gēbi n’obodo ndia ewusiri ike n’ihi ndi bi n’ala ahu.

18 Ayi agaghi-alata n’ulo-ayi, rue mb͕e umu Israel ketaworo, nwoke ọ bula ihe-nketa-ya.

19 N’ihi na ayi agaghi-esoro ha keta si n’ofè Jọdan we gaba n’iru, n’ihi na ihe-nketa-ayi abiaruwo ayi aka n’ofè Jọdan nka n’uzọ ọwuwa-anyanwu.

20 Moses we si ha, Ọ buru na unu eme ihe a; ọ buru na unu ejikere onwe-unu n’iru Jehova ibu agha,

21 ọ buru kwa na onye ọ bula nime unu nke ejikere agabiga Jọdan n’iru Jehova, rue mb͕e Ọ gānapu ndi-iro-Ya ala-ha n’iru Ya,

22 ewe buda ala ahu n’iru Jehova: emesi kwa unu gālata, we buru ndi ikpe nāmaghi site n’aka Jehova, site kwa n’aka Israel; ala nka ewe buru unu ihe-onwunwe n’iru Jehova.

23 Ma ọ buru na unu emeghi otú a, le, unu emehiewo megide Jehova: mara-kwa-nu nmehie-unu, na ọ gāchọputa unu.

24 Unu wuere onwe-unu obodo ufọdu ebe umu-ntakiri-unu gēbi, wu-kwa-ra ìgwé ewu na aturu-unu ogige; me-kwa-nu ihe nēsi n’ọnu-unu puta.

25 Umu Gad na umu Reuben we gwa Moses okwu, si, Ndi-orù-gi gēme dika onye-nwem nēnye iwu.

26 Umu-ntakiri-ayi, na ndinyom-ayi, na anumanu-ayi, na anu-ulo-ayi nile, gānọ n’ebe ahu n’obodo nile nke Gilead:

27 ma ndi-orù-gi gāgabiga, onye ọ bula nke ejikere iso usu-ndi-agha, n’iru Jehova ibu agha, dika onye-nwem nēkwu.

28 Moses we nye Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa Nun, na ndi-isi nke ndi bu nna ebo nile nke umu Israel, iwu bayere ha.

29 Moses we si ha, Ọ buru na umu Gad na umu Reuben eso unu gabiga Jọdan, onye ọ bula nke ejikere ibu agha, n’iru Jehova, ewe buda ala ahu n’iru unu; unu gēnye kwa ha ala Gilead ahu, ibu ihe-onwunwe:

30 ma ọ buru na ha esoghi unu gabiga na njikere, ha gēketa kwa ala n’etiti unu n’ala Kenean.

31 Umu Gad umu Reuben we za, si, Okwu nke Jehova gwaworo ndi-orù-gi, otù a ka ayi gēme

32 Ayi onwe-ayi gāgabiga na njikere n’iru Jehova ba n’ala Kenean, ọ bu kwa n’aka-ayi ka ihe-onwunwe nke ihe-nketa-ayi gādi n’ofè Jọdan.

33 Moses we nye ha, bú umu Gad, na umu Reuben, na nkera ebo Manase nwa Josef, ala-eze Saihon, bú eze ndi-Amorait, na ala-eze Og, bú eze Beshan, ala ahu, dika obodo-ya nile si di n’ókè-ala nile ha, bú obodo nile nke ala ahu buruburu.

34 Umu Gad we wue Dibon, na Atarot, na Aroea;

35 na Atrot-shofan, na Jeza, na Jọgbeha;

36 na Bet-nimra, na Bet-haran: bú obodo ewusiri ike, na ogige ìgwè ewu na aturu.

37 Umu Reuben wu-kwa-ra Heshbon na Eleale, na Kiriataim;

38 na Nebo, na Beal-meon, (ma ab͕anwere aha-ha,) na Sibma: ha we were aha kpọkwasi obodo ha wuru aha.

39 Umu Makia nwa Manase we je Gilead, were ya, napu ya n’aka ndi-Amorait ndi bi nime ya.

40 Moses we were Gilead nye Makia nwa Manase; ọ we biri nime ya.

41 Jaia nwa Manase we je were ebe-obibi nile ha, we kpọ ha Havot-jaia.

42 Noba we je were Kenat, na umu-obodo-ya, we kpọ Noba, n’aha nke ya.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 33

1 Ndia bu nbuli-ije umu Israel, ndi siri n’ala Ijipt puta, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, n’aka Moses na Eron.

2 Moses we de ọpupu nile ha n’akwukwọ dika nbuli-ije nile ha si di, n’okwu-ọnu Jehova: ndia bu kwa nbuli-ije-ha dika ọpupu nile ha si di.

3 Ha we si na Rameses bulie ije n’ọnwa mbu, n’ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa mbu ahu; n’echi nke ngabiga ahu ka umu Israel siri n’Ijipt puta n’aka di elu n’anya ndi Ijipt nile,

4 mb͕e ndi Ijipt nēlì ndi Jehova tib͕uru n’etiti ha, bú ndi nile eburu uzọ mu: ọ bu kwa n’aru ndi bu chi-ha ka Jehova mere ihe nile O kpere n’ikpe.

5 Umu Israel we si na Rameses bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Sukot.

6 Ha si na Sukot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n’Itam, nke di n’usọ ọzara.

7 Ha si n’Itam bulie ije, jeghachi rue Pai-hahairot, nke di n’iru Beal-zefon: ha ma ulo-ikwū-ha n’iru Migdol.

8 Ha si n’iru Hahairot bulie ije, gabiga n’etiti oké osimiri ba n’ọzara: ha je ije nke ubọchi atọ n’ọzara Itam, ma ulo-ikwū-ha nime Mara.

9 Ha si na Mara bulie ije, biarue Ilim: isi-iyi miri iri na abua na ọgu nkwu atọ na iri di kwa n’Ilìm; ha we ma ulo-ikwū-ha n’ebe ahu.

10 Ha si n’Ilim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n’akuku Oké Osimiri Uhie.

11 Ha si n’Oké Osimiri Uhie bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n’ọzara Sin.

12 Ha si n’ọzara Sin bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Dọfka.

13 Ha si na Dọfka bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n’Alush.

14 Ha si n’Alush bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Refidim, ebe ndi Israel nēnweghi miri iṅu.

15 Ha si na Refidim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n’ọzara Sainai.

16 Ha si n’ọzara Sainai bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Kibrot-hataava.

17 Ha si na Kibrot-hataava bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Hazerot.

18 Ha si na Hazerot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Ritma.

19 Ha si na Ritma bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Rimon-perez.

20 Ha si na Rimon-perez bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Libna.

21 Ha si na Libna bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Risa.

22 Ha si na Risa bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Kehilata.

23 Ha si na Kehilata bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n’ugwu Shefa.

24 Ha si n’ugwu Shefa bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Harada.

25 Ha si na Harada bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Makhilot.

26 Ha si na Makhilot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Tahat.

27 Ha si na Tahat bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Tera.

28 Ha si na Tera bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Mitka.

29 Ha si na Mitka bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Hashmona.

30 Ha si na Hashmona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Mosirot.

31 Ha si na Mosirot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Beni-jaakan.

32 Ha si na Beni-jaakan bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Hoa-hagidgad.

33 Ha si na Hoa-hagidgad bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Jọtbata.

34 Ha si na Jọtbata bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n’Abrona.

35 Ha si n’Abrona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n’Ezion-geba.

36 Ha si n’Ezion-geba bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n’ọzara Zin (nke ahu bu Kedesh).

37 Ha si na Kedesh bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n’ugwu Hoa, na nsọtu ala Edom.

38 Eron, bú onye-nchu-àjà, we rigo n’ugwu Hoa n’okwu ọnu Jehova, nwua n’ebe ahu, n’arọ nke-ọgu-abua site na mb͕e umu Israel siri n’ala Ijipt puta, n’ọnwa nke-ise, n’ubọchi mbu nke ọnwa ahu.

39 Eron we b͕a ọgu arọ isi na atọ mb͕e ọ nwuru n’ugwu Hoa.

40 Onye Kenean ahu, bú eze Arad, onye bi na Negeb n’ala Kenean, we nu na umu Israel abiawo.

41 Ha we si n’ugwu Hoa bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Zalmona.

42 Ha si na Zalmona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Punon.

43 Ha si na Punon bulie, ije, ma ulo-ikwū-ha n’Obot.

44 Ha si n’Obot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n’Iye-abarim, n’ókè-ala Moab.

45 Ha si n’Iyim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Dibon-gad.

46 Ha si na Dibon-gad bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n’Almon-diblataim.

47 Ha si n’Almon-diblataim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n’ugwu Abarim, n’iru Nebo.

48 Ha si n’ugwu Abarim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n’ala ihe nādighi nke Moab, n’akuku Jọdan na nso Jeriko.

49 Ha ma ulo-ikwū-ha n’akuku Jọdan, site na Bet-jeshimot rue Ebel-shitim n’ala ihe nādighi nke Moab.

50 Jehova we gwa Moses okwu n’ala ihe nādighi nke Moab n’akuku Jọdan na nso Jeriko, si,

51 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu onwe-unu nāgabiga Jọdan ba n’ala Kenean,

52 unu gānapu kwa n’aka ndi nile bi n’ala ahu ala-ha n’iru unu, unu gāla kwa nkume-ha nile nke emere ka ha yie ihe n’iyi, onyinyo-ha nile awuru awu ka unu gāla kwa n’iyì, me kwa ka ebe di elu nile tọb͕ọrọ n’efu.

53 Unu gēnweta kwa ala ahu, biri nime ya: n’ihi na ọ bu unu ka M’nyeworo ala ahu inweta ya.

54 Unu gēketa kwa ala ahu n’ife-nzà dika ab͕uru nile unu si di; ndi bara uba ka unu gēme ka ala-nketa-ha rie nne, ma ndi di ole-na-ole ka i gēme ka ala-nketa-ha di ntà: ebe ọ bula nzà ahu gāmara onye ọ bula, ọ gēnwe ya; dika ebo nile nke nna-unu-hà si di ka unu gēketa.

55 Ma ọ buru na unu anapughi n’aka ndi bi n’ala ahu ala-ha n’iru unu; ọ gēru kwa na ndi unu kwere ka ha fọdu site na ndi ahu gāghọ kwa obi-ogwu n’anya-unu, ghọ kwa ogwu n’akuku-unu, ha gākpab͕u kwa unu n’ala ahu nke unu onwe-unu nēbi nime ya.

56 O gēru kwa, na dika M’chère ime ha, otú a ka M’gēme unu.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 34

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Nye umu Israel iwu, si ha, Mb͕e unu onwe-unu ganābata n’ala Kenean, (nka bu ala nke gēru unu aka n’ihe-nketa, bú ala Kenean dika ókè-ala-ya-nile si di,)

3 akuku Ndida unu nwe-kwa-ra gēsite n’ọzara Zin n’akuku Edom, ókè-ala Ndida unu nwere gēsite kwa na nsọtu ahu nke Oké Osimiri Nnu nke chere iru n’Iru-anyanwu:

4 ókè-ala unu nwere gēsi kwa na Ndida b͕a buruburu rue nrigo Akrabim, ọ gāgabiga kwa rue Zin: ọpupu-ya nile gēsi kwa na Ndida Kedesh-banea; ọ gāpuru kwa Heza-ada, we gabiga rue Azmon:

5 ókè-ala ahu gēsi kwa n’Azmon b͕a buruburu rue miri-iyi Ijipt, ọpupu-ya nile gādiru kwa oké osimiri.

6 Ókè-ala ọdida-anyanwu kwa, unu gēnwe ọbuná oké osimiri uku ahu na ókè-ya: nka gāburu unu ókè-ala Ọdida-anyanwu

7 Nka gābu-kwa-ra unu ókè-ala Ugwu: unu gēsi n’oké osimiri uku ahu kpaputara onwe-unu ugwu Hoa:

8 unu gēsi n’ugwu Hoa kpaputarue nbata Hemat; ọpupu nile nke ókè-ala ahu gādiru kwa Zedad:

9 ókè-ala ahu gāputaru Zifron, ọpupu-ya nile gādiru kwa Heza-inan: nka gāburu unu ókè-ala Ugwu.

10 Unu gākpaputa-kwa-ra onwe-unu, ka ọ buru ókè-ala Iru-anyanwu, site na Heza-inan rue Shefam:

11 ókè-ala ahu gārida kwa site na Shefam rue Ribla, n’akuku Iru anyanwu Ain; ókè-ala ahu gārida kwa, we metu akuku oké osimiri Kineret nke chere iru n’Iru-anyanwu:

12 ókè-ala ahu gāridaru kwa Jọdan, ọpupu-ya nile gādiru kwa Oké Osimiri Nnu: nka gāburu unu ala, dika ókè-ala-ya nile si di buruburu.

13 Moses we nye umu Israel iwu, si, Nka bu ala ahu nke unu gēketa n’ife-nzà, nke Jehova nyere iwu bayere ya inye ebo iteghete ahu na nkera ebo ahu:

14 n’ihi na ebo umu ndi Reuben dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, na ebo umu ndi Gad dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, anarawo, nkera ebo Manase anarawo kwa, ihe-nketa-ha;

15 ebo abua ahu na nkera ebo ahu anarawo ihe-nketa-ha n’ofè Jọdan nka na nso Jeriko n’akuku Iru-anyanwu, n’uzọ ọwuwa-anyanwu.

16 Jehova we gwa Moses okwu, si,

17 Ndia bu aha ndikom ahu ndi gēme ka unu keta ala ahu: Eleeza, bú onye nchu-àjà, na Joshua nwa Nun.

18 Ọ bu kwa otù onye-isi otù onye-isi site n’ebo ọ bula ka unu gēkuru, ime ka eketa ala ahu.

19 Ndia bu aha ndikom ahu: nke ebo Juda, Keleb nwa Jefune.

20 Nke ebo umu Simeon, Shemuel nwa Amihud.

21 Nke ebo Benjamin, Elidad nwa Kislon.

22 Nke ebo umu Dan otù onye-isi kwa, bú Biku nwa Jọgli.

23 Nke umu Josef: nke ebo umu Manase otù onye-isi, bú Haniel nwa Ifod:

24 nke ebo umu Efraim otù onye-isi kwa, bú Kemuel nwa Shiftan.

25 Nke ebo umu Zebulun otù onye-isi kwa, bú Elizafan nwa Panak.

26 Nke ebo umu Isaka otù onye-isi kwa, bú Paltiel nwa Azan.

27 Nke ebo umu Asha otù onye-isi kwa, bú Ahihud nwa Shelomi.

28 Nke ebo umu Naftali otù onye-isi kwa, bú Padahel nwa Amihud.

29 Ndia bu ndi Jehova nyere iwu ime ka umu Israel Keta ala n’ala Kenean.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 35

1 Jehova we gwa Moses okwu n’ala ihe nādighi nke Moab n’akuku Jọdan na nso Jeriko, si,

2 Nye umu Israel iwu, ka ha si n’ihe-nketa nke ihe-onwunwe-ha nye ndi Livai obodo ibi nime ha; ebe-ita-nri nke obodo ahu gēnwe buruburu ha ka unu gēnye kwa ndi Livai.

3 Obodo ahu gābu-kwa-ra ha ebe ibi nime ha; ebe-ita-nri-ha gādi-kwa-ra anu-ulo-ha, di-kwa-ra àkù-ha, di-kwa-ra anu nile ha.

4 Ebe-ita-nri nke obodo nile, nke unu gēnye ndi Livai, gādi nnù cubit abua na ọgu iri site na mb͕idi obodo we gaba n’azu-ya buruburu.

5 Unu gātu kwa n’azu obodo akuku Iru anyanwu, nnù cubit ise, na akuku Ndida, nnù cubit ise, na akuku Ọdida-anyanwu, nnù cubit ise, na akuku Ugwu cubit ise, obodo gābi kwa n’etiti. Nka gāburu ha ebe-ita-nri nke obodo-ha.

6 Obodo nile nke unu gēnye ndi Livai, ha gābu obodo isi nke nb͕abà, nke unu gēnye ka ob͕u-madu we b͕alaga n’ebe ahu: unu genye kwa ọgu obodo abua na abua tiyere ha.

7 Obodo nile nke unu gēnye ndi Livai bu ọgu obodo abua na asatọ ha na ebe-ita-nri-ha.

8 Ma obodo nile ahu nke unu gēnye site n’ihe-onwunwe nke umu Israel, n’aka ndi bara uba ka unu gānara ọtutu obodo; ma n’aka ndi di ole-na-ole ka unu gānara obodo ole-na-ole: ọ bu dika ala-nketa-ya si di, nke ha nēketa, ka onye ọ bula gēnye ndi Livai site n’obodo-ya nile.

9 Jehova we gwa Moses okwu, si,

10 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu onwe-unu ganāgabiga Jọdan ba n’ala Kenean,

11 unu gārọputa-kwa-ra onwe-unu obodo ufọdu, obodo nb͕aba ka ha gāburu unu; ka ob͕u-madu onye nētib͕u madu n’ọghọm we b͕alaga n’ebe ahu.

12 Obodo nile ahu gābu-kwa-ra unu ebe-nb͕abà agēsi n’aka onye-ọ́bọ̀ b͕alaga; ka ob͕u-madu we ghara inwu, rue mb͕e ọ gēguzo n’iru nzukọm ka ekpe ya ikpe.

13 Obodo ndia nke unu gēnye, obodo isi nke nb͕abá ka ha gāburu unu.

14 Obodo atọ ka unu gēnye n’ofè Jọdan nka, obodo atọ ka unu gēnye kwa n’ala Kenean; obodo nb͕abá ka ha gābu.

15 Obodo isi ndia gāburu umu Israel, buru kwa ọbìa, buru kwa onye bi n’etiti ha, ebe-nb͕abà: ka onye ọ bula nke nētib͕u madu n’ọghọm we b͕alaga n’ebe ahu.

16 Ma ọ buru na ọ were ihe ígwè tie ya, ọ we nwua, ob͕u-madu ka ọ bu: aghaghi ime ka ob͕u-madu ahu nwua.

17 Ọ buru kwa na o were nkume di ya n’aka, bú nke gēme ka madu nwua, tie ya, o we nwua, ob͕u-madu ka ọ bu: aghaghi ime ka ob͕u-madu ahu nwua.

18 Ma ọ buru na o were ihe osisi di ya n’aka, bú nke gēme ka madu nwua, tie ya, o we nwua, ob͕u-madu ka ọ bu: aghaghi ime ka ob͕u-madu ahu nwua.

19 Onye-ọ́bọ̀ ọbara, ya onwe-ya gēme ka ob͕u-madu ahu nwua: mb͕e o zutere ya, ya onwe-ya gēme ka ọ nwua.

20 Ọ buru kwa na ọ kwatue ya n’ikpọ-asì, ma-ọbu tua ya ihe, mb͕e o nēche anwu, o we nwua;

21 ma-ọbu asi na o were aka-ya tie ya n’iro, o we nwua; aghaghi ime ka onye nētib͕u ya nwua; ob͕u-madu ka ọ bu: onye-ọ́bọ̀, ọbara gēme ka ob͕u-madu ahu nwua, mb͕e o zutere ya.

22 Ma ọ buru na ọ bu na mberede ka ọ kwaturu ya, mb͕e ọ nādighi n’iro, ma-ọbu tua ya ihe ọ bula, mb͕e ọ nēcheghi anwu,

23 ma-ọbu asi na o were nkume ọ bula, bú nke gēme ka madu nwua, me ka ọ dakwasi ya, mb͕e ọ nāhughi ya, o we nwua, ma onye ahu abughi onye-iro-ya, ọ bughi kwa onye nāchọ ime ya ihe ọjọ:

24 nzukọm gēkpe kwa n’etiti oti-ihe ahu na onye-ọ́bọ̀ ọbara dika ikpé ndia si di:

25 nzukọm gānaputa kwa ob͕u-madu ahu n’aka onye-ọ́bọ̀ ọbara, nzukọm gēme kwa ka ọ laghachi n’obodo nb͕abà ya, ebe ọ b͕alagara: o gēbi kwa nime ya rue mb͕e ọnwu onye-isi-nchu-àjà, nke ewere manu nsọ ahu te.

26 Ma ọ buru na ob͕u-madu ahu esi n’ókè-ala obodo nb͕abà ya pua ma-ọli, bú ebe ọ b͕alagara;

27 onye-ọ́bọ̀ ọbara ewe huta ya n’azu ókè-ala abodo nb͕abà ya, onye-ọ́bọ̀ ọbara ahu we b͕ue ob͕u-madu ahu, ọ dighi ikpe ọbara mara ya:

28 n’ihi na nime obodo nb͕abà ya ka o gēbi rue mb͕e ọnwu onye-isi-nchu-àjà: ma mb͕e ọnwu onye-isi-nchu-àjà gasiri ob͕u-madu ahu gālaghachi n’ala ihe-onwunwe-ya.

29 Ihe ndia gābu-kwa-ra unu ukpuru ikpé rue ọb͕ọ nile unu n’ebe-obibi-unu nile.

30 Onye ọ bula nke nētib͕u madu, n’ọnu ndi-àmà ka agēb͕u ob͕u-madu ahu: ma nání otù onye-àmà agaghi-ab͕agide madu àmà ka ọ nwua.

31 Unu anara-kwa-la ihe-nb͕aputa n’ọnọdu ndu ob͕u-madu, nke ikpe inwu ọnwu maworo: ma aghaghi ime ka ọ nwua.

32 Unu anara-kwa-la ihe nb͕aputa n’ọnọdu onye b͕alagaworo n’obodo nb͕abà ya, ka ọ we lata ibi n’ala-ya, rue mb͕e ọnwu onye-nchu-àjà.

33 Unu emeru-kwa-la ala ahu nke unu onwe-unu bi nime ya: n’ihi na ọbara, nke ahu nēmeru ala: ma ala, agaghi-ekpuchiri ya nmehie-ya bayere ọbara awusiri nime ya, ma-ọbughi nání n’ọbara nke onye wusiri ya.

34 Eme-kwa-la ka ala ahu, nke unu onwe-unu nēbi nime ya, rua árú, nke Mu onwem nēbi n’etiti ya: n’ihi na Mu onwem, bú Jehova, nēbi n’etiti umu Israel.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 36

1 Ndi-isi nke ndi bu nna nke ab͕uru umu Gilead, nwa Makia, nwa Manase, n’etiti ab͕uru umu Josef, we biarue nso, kwue okwu n’iru Moses, na n’iru ndi-isi, bú ndi-isi nke ndi bu nna nke umu Israel:

2 ha we si, Jehova nyere onye-nwem iwu inye umu Israel ala ahu n’ihe-nketa n’ife-nzà: enye-kwa-ra onye-nwem iwu n’ọnu Jehova iwere ihe-nketa Zelọfehad, bú nwa-nne-ayi, nye umu-ya ndinyom.

3 Ma asi na ha gāghọrọ nwoke ọ bula nke sitere n’umu ebo ọzọ nke umu Israel nwunye, agāgupu kwa ihe-nketa-ha n’ihe-nketa nke nna-ayi-hà, tukwasi ya n’ihe-nketa ebo ahu nke gēnwe ha: ewe gupu ya n’ihe ife-nzà nke ihe-nketa-ayi.

4 Ọ buru kwa na ọ bu jubile nke umu Israel, agātukwasi kwa ihe-nketa-ha n’ihe-nketa nke ebo ahu nke gēnwe ha: ewe gupu ihe-nketa-ha n’ihe-nketa ebo nna-ayi-hà.

5 Moses we nye umu Israel iwu n’okwu-ọnu Jehova, si, Ihe ziri ezi ka ebo umu Josef nēkwu.

6 Nka bu ihe Jehova nyeworo n’iwu bayere umu-ndinyom Zelọfehad, si, Nwoke di nma n’anya-ha ka ha gāburu nwunye; nání ọ bu ab͕uru nke ebo nke ndi bu nna-ha ka ha gāburu nwunye.

7 Ọ dighi kwa ihe-nketa umu Israel nwere gēsi n’ebo fe n’ebo ọzọ buruburu: n’ihi na umu Israel gārapara, nwoke ọ bula n’ihe-nketa ebo nna-ya-hà.

8 Nwa-nwayi nwoke ọ bula, nke nēnweta ihe-nketa n’ebo nile nke umu Israel, gāburu otù nwoke sitere n’ab͕uru nke ebo nna-ya nwunye, ka umu Israel we nweta, nwoke ọ bula ihe-nketa nna-ya-hà.

9 Ọ dighi kwa ihe-nketa gēsi n’ebo fe n’ebo ọzọ buruburu; n’ihi na ebo nile nke umu Israel gārapara, nwoke ọ bula n’ihe-nketa nke aka ya.

10 Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka umu-ndinyom Zelọfehad mere:

11 Mahla, na Tiaza, na Họgla, na Milka, na Noa, bú umu-ndinyom Zelọfehad, we buru nwunye umu umu-nne nna-ha.

12 Ọ bu ndikom nke sitere n’ab͕uru umu Manase nwa Josef ka ha buru nwunye, ihe-nketa-ha we digide n’ebo nke ab͕uru nna-ha.

13 Ndia bu ihe enyere n’iwu, na ikpé, nke Jehova nyere umu Israel n’iwu n’aka Moses n’ala ihe nādighi nke Moab n’akuku Jọdan na nso Jeriko.