Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 21

1 Onye Kenean, bú eze Arad, onye bi na Negeb, we nu na Israel abiawo n’uzọ Atarim; ọ we buso Israel agha, dọta ufọdu nime ha n’agha.

2 Israel we kwere Jehova nkwa, si, Ọ buru na I nye ndi nka n’akam n’ezie, m’gēwezuga kwa obodo-ha nile ka ebibie ha.

3 Jehova we ge nti n’olu Israel, nye ndi Kenean n’aka-ha; ha we wezuga ha na obodo nile ha ka ebibie ha: ewe kpọ aha ebe ahu Họma.

4 Ha we si n’ugwu Hoa bulie ije ga n’uzọ Oké Osimiri Uhie, iga ala Edom buruburu: ma nkpuru-obi ndi Israel enweghi ntachi-obi n’uzọ ahu.

5 Ndi Israel we kwue okwu megide Chineke, megide kwa Moses, si, N’ìhi gini ka unu meworo ka ayi si n’Ijipt rigota inwu n’ọzara nka? n’ihi na achicha adighi, miri adighi kwa; ike agwusiwo kwa nkpuru-obi-ayi n’achicha nka di nfé.

6 Jehova we zite agwọ ahu nke yiri ọku n’etiti ndi Israel, ha we ta ndi Israel aru; ndi riri nne nwupuru n’Israel.

7 Ndi Israel we biakute Moses, si, Ayi emehiewo, n’ihi na ayi ekwuwo okwu megide Jehova, megide kwa gi; gi kpere Jehova, ka Ọ we wezuga agwọ ndia n’aru ayi. Moses we kpe ekpere n’ihi ndi Israel.

8 Jehova we si Moses, Mere onwe-gi agwọ yiri ọku, tukwasi ya n’ọkọlọtọ: o gēru kwa, na onye ọ bula ataworo gādi ndu, mb͕e ọ huworo ya anya.

9 Moses we me agwọ ọla, tukwasi ya n’ọkọlọtọ ahu: o rue, ma ọ buru na agwọ atawo madu, na ọ di ndu, mb͕e ọ legidere agwọ ọla ahu anya.

10 Umu Israel we bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n’Obot.

11 Ha si n’Obot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n’Iye-abarim, n’ọzara ahu nke di n’iru Moab, n’uzọ ọwuwa-anyanwu.

12 Ha si n’ebe ahu bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Zered.

13 Ha si n’ebe ahu bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n’ofè Anon, nke di n’ọzara, nke si n’ókè-ala ndi-Amorait aputa: n’ihi na Anon bu ókè-ala Moab, n’etiti Moab na ndi-Amorait.

14 N’ihi ya ka anāsi n’akwukwọ agha di iche iche nke Jehova,

Vaheb nime Sufa,

Na ndagwurugwu nile nke Anon,

15 Na nkpọrube nke ndagwurugwu ahu,

Bú nke nēwezuga onwe-ya n’uzọ ebe-obibi A,

Nke nādabere kwa n’ókè-ala Moab.

16 Ha si n’ebe ahu jerue Bia: nke ahu bu olùlù-miri ahu nke Jehova gwara Moses okwu bayere ya, si, Chikọta ndim, M’gēnye kwa ha miri.

17 Mb͕e ahu Israel nābù abù a, si:

Rigo, gi olùlù-miri; zanu ya:

18 Olùlù-miri, ndi-isi gwuru ya,

Ndi amara aha-ha nke ndi Israel doziri ya,

Ha ji nkpa-n’aka onye nēnye ukpuru, ji kwa nkpa-n’aka nile ha, me ya.

Ha si n’ọzara ahu jerue Matana:

19 si na Matana jerue Nahaliel: si na Nahaliel jerue Bamot:

20 si na Bamot jerue ndagwurugwu ahu nke di n’ọhia Moab, rue elu Pisga, nke nēle anya n’ebe ala ahu nke tọb͕ọrọ n’efu di.

21 Israel we ziga ndi-ozi jekuru Saihon, bú eze ndi-Amorait, si,

22 Ka m’gabiga nime ala-gi: ayi agaghi-ewezuga onwe-ayi ba n’ọhia, ma-ọbu n’ubi-vine, ayi agaghi-aṅu miri olùlù-miri: n’uzọ eze ka ayi ganēje, rue mb͕e ayi gāgabiga ókè- ala-gi.

23 Ma Saihon ekweghi ka Israel gabiga nime ókè-ala-ya: ma Saihon chikọtara ndi-ya nile, pua izute Israel rue ọzara, biarue Jehaz: ọ we buso Israel agha.

24 Israel we were ọnu mma-agha tib͕ue ya, we nweta ala-ya site n’Anon rue Jekob, rue umu Amon: n’ihi na ókè-ala umu Amon siri ike.

25 Israel we were obodo ndia nile: Israel we biri n’obodo nile nke ndi-Amorait, nime Heshbon, na nime umu-obodo-ya nile.

26 N’ihi na Heshbon ahu, obodo Saihon, bú eze ndi-Amorait, ka ọ bu, eze ahu buso-kwa-rari eze gara aga Nke Moab agha, we nara ala-ya nile n’aka-ya, rue Anon.

27 N’ihi ya ndi nātu ilu nāsi,

Banu nime Heshbon,

Ka ewue obodo Saihon, ka eguzosi kwa ya ike:

28 N’ihi na ọku esiwo na Heshbon pua,

Ire-ọku n’obodo Saihon:

O ripiawo A nke Moab,

Ndi-nwe ebe nile di elu nke Anon.

29 Ahuhu gādiri gi, Moab!

I lawo n’iyì, gi ndi Kemosh:

Ọ nyewo umu-ya ndikom, dika ndi b͕apuru ab͕apu,

Nye kwa umu-ya ndinyom ije na ndọta-n’agha,

N’aka Saihon, bú eze ndi-Amorait.

30 Ayi ab͕awo ha àkú; Heshbon alawo n’iyì rue Dibon,

Ayi emewo ka ọ tọb͕ọrọ n’efu rue Nofa,

Nke diruru Medeba.

31 Israel we biri n’ala ndi-Amorait.

32 Moses we ziga iledo Jeza, ha we were umu-obodo-ya nile, napu ndi-Amorait ndi biri n’ebe ahu ala-ha.

33 Ha we chigharia, rigo n’uzọ Bechan: Og, bú eze Beshan, we puta izute ha, ya onwe-ya na ndi-ya nile, ibu agha n’Edrei.

34 Jehova we si Moses, Atula egwu ya; n’ihi na ọ bu n’aka-gi ka M’nyeworo ya, na ndi-ya nile, na ala-ya; i gēme kwa ya dika i mere Saihon, bú eze ndi-Amorait, nke biri nime Heshbon.

35 Ha we tib͕ue ya, na umu-ya ndikom, na ndi-ya nile, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru arapuru ya: ha we nweta ala-ya.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 22

1 Umu Israel we bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n’ala ihe nādighi nke Moab n’ofè Jọdan na nso Jeriko.

2 Belak nwa Zipoa we hu ihe nile Israel mereri ndi-Amorait.

3 Moab we tua ujọ ndi Israel nke-uku, n’ihi na ọtutu ka ha di; ike gwusia Moab n’iru umu Israel.

4 Moab we si ndi-okenye Midian, Ub͕u a nkpọkọta nka gārachapu ihe nile nke di ayi buruburu, dika ehi nārachapu akwukwọ ndu nke ọhia. Belak nwa Zipoa bu kwa eze Moab na mb͕e ahu.

5 Ọ we zigara Belam nwa Beoa ndi-ozi, rue Petoa, nke di n’akuku Osimiri, bú ala nke umu ndi-ya, ikpọ ya, si, Le, otù ndi esiwo n’Ijipt puta: le, ha ekpuchiwo iru ala, ndi ahu nānọ kwa na ncherita-irum:

6 ma ub͕u a, biko, bia, buaram ndi nka ọnu; n’ihi na ndi di ike ka ọ bu karim: eleghi anya m’gēnwe ike, ka ayi we tib͕ue ha, m’we chupu ha n’ala: n’ihi na amawom na onye i nāgọzi bu onye agọziri agọzi, ma onye i nābu ọnu bu onye anābu ọnu.

7 Ndi-okenye Moab na ndi-okenye Midian we je, ihe nile iji ju ase di kwa n’aka-ha; ha we biakute Belam, gwa ya okwu nile nke Belak.

8 o we si ha, Nọnu ọnọdu-abali n’ebe a n’abali a, m’gēweghachi-kwa-ra unu okwu, dika Jehova si agwam okwu: ndi-isi Moab we nọyere Belam.

9 Chineke we biakute Belam, si, Òle ndi bu ndikom ndia nọyere gi?

10 Belam we si Chineke, Belak nwa Zipoa, bú eze Moab, eziteworom ozi, si,

11 Le, ndi ahu nke si n’Ijipt puta, ọ nēkpuchi kwa iru ala: ub͕u a, bia kọcharam ha; eleghi anya m’gēnwe ike ibuso ha agha, m’gāchupu kwa ha.

12 Chineke we si Belam, Esola ha je; abula ndi Israel ọnu; n’ihi na ndi agọziri agọzi ka ha bu.

13 Belam we bilie n’ututu, si ndi-isi Belak, Lanu n’ala-unu: n’ihi na Jehova n’aju ikwe ka m’soro unu je.

14 Ndi-isi Moab we bilie, biakute Belak, si, Belam nāju isoro ayi bia.

15 Belak we ziga kwa ndi-isi ọzọ, di ọtutu, di kwa nsọpuru, kari ndi ahu.

16 Ha we biakute Belam, si ya, Otú a ka Belak nwa Zipoa siri, Biko, ekwela ka ihe b͕ochie gi ibiakutem:

17 n’ihi na m’ghaghi isọpuru gi nke-uku, ọ bu kwa ihe ọ bula i gāsim ka m’gēme: ma, biko, bia, kọcharam ndi nka.

18 Belam we za, si ndi-orù Belak, Ọ buru na Belak enyewo m ojuju ulo-ya nke ọla-ọcha na ọla-edo, apughm igabiga okwu-ọnu nke Jehova, bú Chinekem, ime ihe ntà ma-ọbu ihe uku.

19 Ma ub͕u a, biko, nọdunu n’ebe a, ọbuná unu onwe-unu, abali a, ka m’we mara uka Jehova gākpayere m ọzọ.

20 Chineke we biakute Belam n’abali, si ya, Ọ buru na ọ bu ikpọ gi ka ndikom ahu biara, gi bilie, soro ha je; ma nání okwu nke M’nāgwa gi, nke ahu ka i gēme.

21 Belam we bilie n’ututu, jikwa nne-inyinya-ibu-ya soro ndi-isi Moab je.

22 Iwe Chineke we di ọku n’ihi na ọ nēje: mọ-ozi nke Jehova we guzo onwe-ya n’uzọ ibu onye nēmegide ya. Ma ya onwe-ya nānọkwasi na nne-inyinya-ibu-ya, umu-okorọbia-ya abua so kwa ya.

23 Nne-inyinya-ibu ahu we hu mọ-ozi nke Jehova ka o nēguzo n’uzọ, mma-agha-ya amiputara amiputa di kwa n’aka-ya: nne-inyinya-ibu ahu we wezuga onwe-ya n’uzọ, je n’ọhia: Belam we tie nne-inyinya-ibu ahu ihe, iwezuga ya ba n’uzọ.

24 Mọ-ozi nke Jehova we guzo n’uzọ di warara n’etiti ubi-vine, ogige di n’otú akuku, ogige di kwa n’akuku nke-ọzọ.

25 Nne-inyinya-ibu ahu we hu mọ-ozi nke Jehova, ọ we nuba onwe-ya na mb͕idi, nuba kwa ukwu Belam na mb͕idi ahu: o we tie ya ihe ọzọ.

26 Mọ-ozi nke Jehova we gabiga ọzọ, guzo n’ebe di nkpa, ebe uzọ nādighi madu gēwezuga onwe-ya ga n’aka-nri ma-ọbu n’aka-ekpe.

27 Nne-inyinya-ibu ahu we hu mọ-ozi nke Jehova, o we makpuru n’okpuru Belam: iwe Belam we di ọku, o were nkpa-n’aka-ya tie nne-inyinya-ibu ahu.

28 Jehova we saghe ọnu nne-inyinya-ibu ahu, ọ we si Belam, Gini ka m’meworo gi, na itiwom ihe ub͕ò atọ ndia?

29 Belam we si nne-inyinya-ibu ahu, N’ihi na i kwaram emò: ọ gādim nọ̄ nma ma asi na mma-agha di n’akam, n’ihi na ub͕u a m’gēb͕uwori gi.

30 Nne-inyinya-ibu ahu we si Belam, Mù onwem abughi nne-inyinya-ibu-gi, nke i nọkwasiworo nam n’ogologo mb͕e-gi rue ta? ànọm nēme gi otú a ma-ọli? Ọ si, É-è.

31 Jehova we saghe anya Belam abua, o we hu mọ-ozi nke Jehova ka ọ nēguzo n’uzọ, mma-agha-ya amiputara amiputa di kwa n’aka-ya: o we rube isi, kpọ isi ala n’iru-ya.

32 Mọ-ozi nke Jehova we si ya, N’ìhi gini ka i tiworo nne-inyinya-ibu-gi ihe ub͕ò atọ ndia? le, mu onwem aputawo ibu onye-nmegide, n’ihi na uzọ-gi nārida na nbibi n’irum:

33 nne-inyinya-ibu-gi we hum, wezuga onwe-ya n’irum ub͕ò atọ ndia: ọ buru na o wezugaghi onwe-ya site n’irum, n’ezie ub͕u a ọ bu kwa gi onwe-gi ka m’gēb͕uwori, ma ya onwe-ya ka m’gēmewori ka ọ di ndu.

34 Belam we si mọ-ozi nke Jehova, Emehiewom; n’ihi na amaghm na gi onwe-gi nēguzo onwe-gi izutem n’uzọ: ma ub͕u a, ọ buru na ọ jọ njọ n’anya-gi, m’gālaghachi n’onwem.

35 Mọ-ozi nke Jehova we si Belam, Soro ndikom ahu je: ma nání okwu ahu nke m’gāgwa gi, nke ahu ka i gēkwu. Belam we soro ndi-isi Belak je.

36 Belak we nu na Belam abiawo, o we pua izute ya rue obodo Moab, nke di n’ókè-ala Anon, nke di na nsọtu ókè-ala ahu.

37 Belak we si Belam, Èziteghm ozi ike ike n’ebe i nọ ikpọ gi? n’ìhi gini ka i nābiakuteghm? ọ̀ bu ezi-okwu na apughm isọpuru gi?

38 Belam we si Belak, abiakutewom i: ub͕u a ọ̀ di ike ọ bula m’nwere ikwu ihe ọ bula? okwu ahu nke Chineke gētiye n’ọnum, nke ahu ka m’gēkwu.

39 Belam we soro Belak je, ha we biarue Kiriat-huzot.

40 Belak we chua ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu n’àjà, we zigara Belam, ziga-kwa-ra ndi-isi ndi ha na ya nọ.

41 O rue, n’ututu, na Belak kuru Belam, me ka ọ rigo na Bamot-beal, ọ we si n’ebe ahu hu nsọtu ndi Israel.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 23

1 Belam we si Belak, Wuerem ebe-ichu-àjà asa n’ebe a, dozi-kwa-ram oke-ehi asa na ebulu asa n’ebe a.

2 Belak we me dika Belam kwuru; Belak na Belam we sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n’ebe-ichu-àjà ọ bula.

3 Belam we si Belak, Guzo onwe-gi n’akuku àjà-nsure-ọku-gi, ma ka m’je; eleghi anya Jehova gābia izutem: ma ihe ọ bula Ọ gēme ka m’hu m’gēgosi kwa gi ya. Ọ we je ugwu nke ọhia nādighi.

4 Chineke we zute Belam: ọ we si Ya, Ebe-ichu-àjà asa ahu ka m’doworo n’usoro, m’we sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n’ebe-ichu-aja ọ bula.

5 Jehova we tiye okwu n’ọnu Belam, si, Jeghachikuru Belak, ọ bu kwa otú a ka i gēkwu.

6 Ọ we jeghachikuru ya, ma, le, ọ nēguzo n’akuku àjà-nsure-ọku-ya, ya onwe-ya na ndi-isi Moab nile.

7 O we tua ilu-ya, si,

N’Eram ka Belak nēsi dutem,

Eze Moab si n’ugwu Iru-anyanwu dutem: si,

Bia, buaram Jekob ọnu,

Bia kwa, wesa Israel iwe.

8 Gini, m’gākọcha? Chineke akọchaghi.

Gini kwa m’gēwe iwe? Jehova eweghi iwe.

9 N’ihi na n’elu oké nkume ndia ka m’si ahú ya,

Ọ bu kwa n’ugwu ntà ndia ka m’si ekiri ya:

Le, otù ndi ka ọ bu, ọ nēbi iche,

Ọ dighi-agu onwe-ya n’etiti mba nile.

10 Ònye gutaworo ájá Jekob,

Na ọnu-ọgugu nke otù uzọ n’uzọ anọ nke Israel?

Ka mu onwem nwua, ọnwu nke ndi ziri ezi,

Ka ikpe-azum di kwa ka nke ya!

11 Belak we si Belam, Gini ka i meworom? ọ bu ikọcha ndi-irom ka m’kutere gi, ma, le, i gọziwo ha nke-uku.

12 Ọ we za, si, Ihe Jehova nētiye n’ọnum, ọ̀ bughi nka ka m’gēlezi anya ikwu?

13 Belak we si ya, Biko, sorom je n’ebe ọzọ, ebe i gēsi hu ha; nání nsọtu-ha ka i gāhu, ma i gaghi-ahu ha nile: gi kọcha-kwa-ram ha site n’ebe ahu.

14 Ọ we kuru ya je ọhia Zofim, rue elu Pisga, o wue ebe-ichu-àjà asa, sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n’ebe-ichu-àjà ọ bula.

15 Ọ si Belak, Guzo onwe-gi n’ebe a n’akuku àjà-nsure-ọku-gi, ma mu onwem gēzute Jehova n’ebe ahu.

16 Jehova we zute Belam, tiye okwu n’ọnu-ya, si, Jeghachikuru Belak, ọ bu kwa otú a ka i gēkwu.

17 Ọ we biakute ya, ma, le, ọ nēguzo n’akuku àjà-nsure-ọku-ya, ya na ndi-isi Moab. Belak we si ya, Gini ka Jehova kwuworo?

18 Ọ we tua ilu-ya, si,

Bilie, Belak, nuru kwa;

Ṅam nti, nwa Zipoa:

19 Chineke abughi madu, nke O gēkwu okwu-ugha;

Ọ bughi kwa nwa madu, nke Ọ gēlogha:

Ọ̀ bu na Ya onwe-ya asiwo na Ọ gēme ihe, ma O meghi ya?

Ma-ọbu Ò kwuwo okwu, ma O meghi ya ka o guzosie ike?

20 Le, ọ bu igọzi ka m’nataworo iwu:

Ọ gọziwo kwa, apughkwam itughari ya.

21 O legideghi ajọ ihe anya nime Jekob,

Ọ hughi kwa nmeb͕u n’Israel:

Jehova, bú Chineke-ya, nọyere ya,

Iti-nkpu nke eze di kwa n’etiti ha.

22 Chineke nēme ka ha si n’ala Ijipt puta;

Ume dika ume atu ka ọ nwere

23 N’ihi na ọb͕ub͕a-afa adighi megide Jekob,

Iju-ase adighi kwa megide Israel:

Na mb͕e ahu ka agēkwu okwu bayere Jekob, baye-kwa-ra Israel, si,

Le ihe Chineke meworo!

24 Le, ndi ahu nēbili dika nne-ọdum,

Dika ọdum ka ọ nēweli onwe-ya:

Ọ gaghi-edina rue mb͕e ọ gēri ihe ọ dọb͕utara,

Ṅu kwa ọbara nke ndi eb͕uru eb͕u.

25 Belak we si Belam, Akọcha-kwa-la ha ma-ọli agọzi-kwa-la ha ma-ọli.

26 Belam we za, si Belak, Àgwaghm i, si, Ihe nile nke Jehova gēkwu, nke ahu ka m’gēme?

27 Belak we si Belam, Biko, bia, m’gēkuru gi je ebe ọzọ; eleghi anya ọ gēzi ezi n’anya Chineke ka i si n’ebe ahu kọcharam ha.

28 Belak we kuru Belam je n’elu Peoa, nke nēle anya n’ebe ala ahu nke tọb͕ọrọ n’efu di.

29 Belam we si Belak, Wuerem ebe-ichu-àjà asa n’ebe a, dozi-kwa-ram oke-ehi asa na ebulu asa n’ebe a.

30 Belak we me dika Belam siri, ọ we sure otù oke-ehi na otù ebulu n’ebe-ichu-aja ọ bula.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 24

1 Ma mb͕e Belam huru na ọ di nma n’anya Jehova igọzi Israel, ọ jeghi, dika o si eje ub͕ò ub͕ò, izute ọb͕ub͕a-afa di iche iche, ma o chere iru-ya n’ọzara.

2 Belam we welie anya-ya abua, hu Israel ka ha nānọ n’ulo-ikwū-ha dika ebo nile ha si di; Mọ nke Chineke we dikwasi ya.

3 Ọ we tua ilu-ya, si,

Ihe nke si n’ọnu Belam nwa Beoa puta,

Bú ihe nke si n’ọnu nwoke ahu puta, onye anya-ya mechiri emechi:

4 Ihe nke si n’ọnu-ya puta, bú onye nānu okwu-ọnu nile nke Chineke,

Onye nāhu ọhù nke Onye ahu Nke puru ime ihe nile,

Mb͕e ọ nāda, ma anya-ya abua saghere asaghe:

5 Le ka ulo-ikwū-gi nile si ma nọ̄ nma, Jekob!

Le ka ebe-obibi-gi nile si ma nọ̄ nma, Israel!

6 Dika ndagwurugwu di iche iche ka esetiworo ha,

Dika ubi di iche iche ab͕ara ogige n’akuku osimiri,

Dika osisi lign-aloes nke Jehova kuworo,

Dika osisi cedar n’akuku miri.

7 Miri nēsi n’ite-miri-ya nile rùputa,

Nkpuru-ya gādi kwa n’ọtutu miri,

Eze-ya gādi kwa elu kari Egag,

Agēbuli kwa ala-eze-ya.

8 Chineke nēme ka o si n’Ijipt puta;

Ume dika ume atu ka ọ nwere:

O gēripia mba di iche iche, bú ndi nākpab͕u ya,

Ọ bu kwa ọkpukpu nile ha ka ọ gēkpecha,

Were kwa àkú-ya nile b͕arua ha aru.

9 Ọ makpuru, o dinara dika ọdum,

Na dika nne-ọdum; ònye gēme ka o bilie?

Onye ọ bula nke nāgọzi gi bu onye agọziri agọzi,

Onye ọ bula nke nābu gi ọnu bu kwa onye anābu ọnu.

10 Iwe Belak we di ọku megide Belam, ọ kua aka-ya abua: Belak we si Belam, Ọ bu ikọcha ndi-irom ka m’kpọrọ gi, ma, le, i gọziwo ha nọ̄ ub͕ò atọ ndia.

11 Ma ub͕u a, b͕alaga n’onwe-gi la n’ebe nke gi: asirim na m’gāsọpuru gi nke-uku; ma, le, Jehova eb͕ochiwo gi na nsọpuru.

12 Belam we si Belak, Ọ̀ bughi kwa ndi-ozi-gi, bú ndi i ziterem, ka m’gwara okwu, si,

13 Ọ buru na Belak enyem ojuju ulo-ya nke ọla-ọcha na ọla-edo, apughm igabiga okwu-ọnu Jehova, ime ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ site n’obi nke akam, ihe nke Jehova gēkwu, nke ahu ka m’gēkwu?

14 Ma ub͕u a, le, anamalakuru ndim: bia, m’gādu gi ọdu ihe ndi nka gēme ndi-gi na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.

15 Ọ we tua ilu-ya, si,

Ihe nke si n’ọnu Belam nwa Beoa puta,

Bú ihe nke si n’ọnu nwoke ahu puta, onye anya-ya mechiri emechi:

16 Ihe nke si n’ọnu-ya puta, bú onye nānu okwu-ọnu nile nke Chineke,

Onye nāma kwa ihe-ọmuma nke Onye kachasi ihe nile elu,

Ọhù nke Onye ahu Nke puru ime ihe nile ka ọ nāhu,

Mb͕e ọ nāda, ma anya-ya abua saghere asaghe:

17 Anamahu ya, ma ọ bughi ub͕u a:

Anamekiri ya, ma ọ bughi na nso:

Otù kpakpando gēsi na Jekob zọlie ije,

Nkpa-n’aka eze gēsi kwa n’Israel bilie,

We mapue akuku nile nke Moab,

Gwuda kwa umu ọkpukpọ-ùzù nile,

18 Edom gābu kwa ihe-nnweta,

Sia gābu kwa ihe-nnweta, bú ndi-iro-ya;

Israel nēme kwa ihe-dìnkpà.

19 Otù onye gēsi kwa na Jekob zọda mba nile,

Ọ geme kwa ka ndi foduru si n’obodo lapu n’iyì.

20 Ọ we hu Amalek, we tua ilu-ya, si,

Mba mbu nke mba nile ka Amalek bu;

Ma ikpe-azu-ya gābiaru ila-n’iyì.

21 Ọ we hu ndi-Kinait, we tua ilu-ya, si,

Ebe nke nādigide adigide ka ebe-obibi-gi di,

Etiye-kwa-ra akwu-gi na nkume di elu.

22 Ma otú ọ di, Ken gābu ihe irechapu ọku,

Rùe ole mb͕e? Asiria gādọta gi n’agha.

23 Ọ we tua ilu-ya, si,

Ewū! ònye gādi ndu site na mb͕e Chineke nēdo ya?

24 Ma ub͕ọ ufọdu gēsi n’akuku Kitim bia,

Ha gēweda kwa Asiria n’ala, weda kwa Iba n’ala,

Ọzọ kwa, ya onwe-ya gābiaru ila-n’iyì.

25 Belam we bilie, je, laghachi n’ebe-ya; ọzọ kwa, Belak jere n’uzọ-ya.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 25

1 Israel we biri na Shitim, ndi Israel we malite isoro umu-ndinyom Moab nākwa iko:

2 ndinyom ahu we kpọ ndi Israel ibia n’àjà chi nile ha; ndi Israel we rie ihe, kpọ isi ala nye chi nile ha.

3 Israel we kekọta onwe-ya n’aru Beal-peoa: iwe Jehova we di ọku megide Israel.

4 Jehova we si Moses, Chiri ndi-isi nile nke ndim, kpọgidere ha Jehova n’iru anyanwu, ka idi-ọku nke iwe Jehova we si n’aru Israel laghachi.

5 Moses we si ndi-ikpé Israel, B͕uenu, onye ọ bula ya b͕ue ndikom-ya ndi nēkekọta onwe-ha n’aru Beal-peoa.

6 Ma, le, otù nwoke nime umu Israel biara, weta nso umu-nne-ya otù nwayi Midian n’anya Moses, na n’anya nzukọ nile nke umu Israel, mb͕e ha onwe ha nākwa ákwá n’ọnu-uzọ ulo-kwū nzute.

7 Finehas, nwa-nwoke Eleeza, nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, we hu ya, o we si n’etiti nzukọ Israel bilie, were ube n’aka-ya,

8 soro nwoke Israel ahu ba nime ulo-ndina-ya, mapue ha abua, bú nwoke Israel ahu, na nwayi ahu rue ime-afọ-ya. Ewe b͕ochie ihe otiti ahu n’aru umu Israel.

9 Ma ndi nwuru n’ihe-otiti ahu di orú nnù uzọ atọ.

10 Jehova we gwa Moses okwu, si,

11 Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, emewo ka ọnumam si n’aru umu Israel laghachi, n’iwere ekworom kwo ekworo n’etiti ha, M’we ghara ime ka umu Israel gwusia n’ekworom.

12 N’ihi ya si ya, Le, anamenye ya ọb͕ub͕a-ndum nke udo:

13 ọ gāburu ya, buru kwa nkpuru-ya gānọchi ya, ọb͕ub͕a-ndu ọlu-nchu-àjà ebighi-ebi; n’ihi na o kworo ekworo bayere Chineke-ya, kpuchi-kwa-ra umu Israel nmehie-ha.

14 Ma aha nwoke Israel ahu nke etib͕uru etib͕u, onye etib͕uru ya na nwayi Midian, bu Zimri, nwa Salu, bú onye-isi nke otú ulo nna nke ndi Simeon.

15 Aha nwayi Midian ahu nke etib͕uru etib͕u bu Kọzbi, nwa Zua; onye-isi mba nke otù ulo nna na Midian ka ọ bu.

16 Jehova we gwa Moses okwu, si,

17 Kpab͕ue ndi Midian, tib͕u kwa ha:

18 n’ihi na ha nākpab͕u unu n’aghughọ nile ha, nke ha ji ghọb͕u unu n’okwu Peoa, na n’okwu kọzbi, bú nwa-nwayi onye-isi Midian, nwa-nne-ha nwayi, nke etib͕uru n’ubọchi ihe-otiti ahu n’okwu Peoa.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 26

1 O rue, mb͕e ihe-otiti ahu gasiri, na Jehova gwara Moses na Eleeza nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, okwu, si,

2 Gutanu ọnu-ọgugu nzukọ nile nke umu Israel, site n’onye b͕ara orú arọ we gaba n’iru, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, onye ọ bula nke nāpukuru usu-ndi-agha n’Israel.

3 Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we kpayere ha uka n’ala ihe nādighi nke Moab n’akuku Jọdan na nso Jeriko, si,

4 Gutanu ọnu-ọgugu ndi Israel, site n’onye b͕ara orú arọ we gaba n’iru; dika Jehova nyere Moses na umu Israel iwu, bú ndi nēsi n’ala Ijipt puta.

5 Reuben, bú ọkpara Israel: umu-ndikom Reuben; nke Hanok bu ab͕uru ndi Hanok: nke Palu bu ab͕uru ndi Palu:

6 nke Hezron bu ab͕uru ndi Hezron: nke Kami bu ab͕uru ndi Kami.

7 Ndia bu ab͕uru ndi Reuben: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ ise, na nnù iteghete, na ọgu isi, na iri.

8 Umu ndikom Palu kwa; Eliab.

9 Umu-ndikom Eliab; Nemuel, na Detan, na Abairam. Ndia bu Detan ahu na Abairam ahu, ndi akpọrọ nke nzukọ Israel, ndi lusoro Moses, luso kwa Eron, ọ̀gù nime nzukọ Kora, mb͕e ha lusoro Jehova ọ̀gù:

10 ala we saghe ọnu-ya, loda ha na Kora, mb͕e nzukọ ahu nwuru; mb͕e ọku ahu ripiara ọgu ndikom iri-na-abua na iri ahu, ha we ghọ ihe-iriba-ama.

11 Ma umu-ndikom Kora anwughi.

12 Umu-ndikom Simeon, dika agburu nile ha si di: nke Nemuel bu ab͕uru ndi Nemuel: nke Jamin bu ab͕uru ndi Jamin: nke Jakin bu ab͕uru ndi Jakin:

13 nke Zera bu ab͕uru ndi Zera: nke Shaul bu ab͕uru ndi Shaul.

14 Ndia bu ab͕uru ndi Simeon, orú nnù uzọ abua, na nnù iri-na-ise, na ọgu iri.

15 Umu-ndikom Gad, dika ab͕uru nile ha si di: nke Zefon bu ab͕uru ndi Zefon: nke Hagi bu ab͕uru ndi Hagi: nke Shuni bu ab͕uru ndi Shuni:

16 nke Ọzni bu ab͕uru ndi Ọzni: nke Iri bu ab͕uru ndi Iri:

17 nke Arod bu ab͕uru ndi Arod: nke Areli bu ab͕uru ndi Areli.

18 Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Gad, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ ise, na nnu, na ọgu ise.

19 Umu-ndikom Juda, Ia na Onan: ma Ia na Onan nwuru n’ala Kenean.

20 Umu-ndikom Juda, dika ab͕uru nile ha si di, bu; nke Shila bu ab͕uru ndi Shila: nke Perez bu ab͕uru ndi Perez: nke Zera bu ab͕uru ndi Zera.

21 Umu-ndikom Perez bu kwa; nke Hezron bu ab͕uru ndi Hezron: nke Hamul bu ab͕uru ndi Hamul.

22 Ndia bu ab͕uru Juda, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ iteghete, na nnù iri-na-otù, na ọgu ise.

23 Umu-ndikom Isaka, dika ab͕uru nile ha si di: nke Tola bu ab͕uru ndi Tola: nke Puva bu ab͕uru ndi-Punait:

24 nke Jashub bu ab͕uru ndi Jashub: nke Shimron bu ab͕uru ndi Shimron.

25 Ndia bu ab͕uru Isaka, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ asatọ, na ọgu iri-na-ise.

26 Umu-ndikom Zebulun, dika ab͕uru nile ha si di: nke Sered bu ab͕uru ndi Sered: nke Ilon bu ab͕uru ndi Ilon: nke Jahleel bu ab͕uru ndi Jahleel.

27 Ndia bu ab͕uru ndi Zebulun, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ asa, na nnù iri-na-otù, na ọgu ise.

28 Umu-ndikom Josef, dika ab͕uru nile ha si di: Manase na Efraim.

29 Umu-ndikom Manase: nke Makia bu ab͕uru ndi Makia: Makia we muta Gilead: nke Gilead bu ab͕uru ndi Gilead.

30 Ndia bu umu-ndikom Gilead: nke Ieza bu ab͕uru ndi Ieza: nke Hilek bu ab͕uru ndi Hilek.

31 nke Asriel bu ab͕uru ndi Asriel: nke Shekem bu ab͕uru ndi Shekem:

32 nke Shemida bu ab͕uru ndi Shemida: nke Hefa bu ab͕uru ndi Hefa.

33 Ma Zelọfehad nwa Hefa enweghi umu-ndikom, ma ọ nwere umu-ndinyom: aha umu-ndinyom Zelọfehad bu Mahla, na Noa, na Họgla, na Milka, na Tiaza.

34 Ndia bu ab͕uru Manase: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ isi, na nnù iri-na-otù, na ọgu iri-na-ise.

35 Ndia bu umu-ndikom Efraim, dika ab͕uru nile ha si di: nke Shutela bu ab͕uru ndi Shutela: nke Beka bu ab͕uru ndi Beka: nke Tahan bu ab͕uru ndi Tahan.

36 Ndia bu umu-ndikom Shutela: nke Iran bu ab͕uru ndi Iran.

37 Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Efraim, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ anọ, na nnù, na ọgu ise. Ndia bu umu-ndikom Josef, dika ab͕uru nile ha si di.

38 Umu-ndikom Benjamin, dika ab͕uru nile ha si di: nke Bela bu ab͕uru ndi Bela: nke Ashbil bu ab͕uru ndi Ashbil: nke Ahairam bu ab͕uru ndi Ahairam:

39 nke Shefufan bu ab͕uru ndi-Shufamait: nke Hufan bu ab͕uru ndi Hufan.

40 Umu-ndikom Bela bu Ad na Neaman: nke Ad bu ab͕uru ndi Ad: nke Neaman bu ab͕uru ndi Neaman.

41 Ndia bu umu-ndikom Benjamin, dika ab͕uru nile ha si di: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ ise, na nnù iri-na-anọ.

42 Ndia bu umu-ndikom Dan, dika ab͕uru nile ha si di: nke Shuham bu ab͕uru ndi Shuham. Ndia bu ab͕uru nke Dan, dika ab͕uru nile ha si di.

43 Ab͕uru nile nke ndi Shuham, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, di orú nnù uzọ asatọ, na otù nnù.

44 Umu-ndikom Asha, dika ab͕uru nile ha si di: nke Imna bu ab͕uru ndi Imna: nke Ishvi bu ab͕uru ndi Ishvi: nke Beria bu ab͕uru ndi Beria.

45 Nke umu-ndikom Beria: nke Hiba bu ab͕uru ndi Hiba: nke Malkiel bu ab͕uru ndi Malkiel.

46 Ma aha nwa-nwayi Asha bu Sera.

47 Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Asha, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ isi, na nnù iri-na-atọ, na ọgu iri.

48 Umu-ndikom Naftali, dika ab͕uru nile ha si di: nke Jahzeel bu ab͕uru ndi Jahzeel: nke Guni bu ab͕uru ndi Guni:

49 nke Jiza bu ab͕uru ndi Jiza: nke Shilem bu ab͕uru ndi Shilem.

50 Ndia bu ab͕uru Naftali, dika ab͕uru nile ha si di: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ ise, na nnù iri-na-atọ, na ọgu iri.

51 Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke umu Israel, orú nnù ogu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù anọ, na ọgu isi, na iri.

52 Jehova we gwa Moses okwu, si,

53 Ndia ka agēkere ala ahu n’ihe-nketa, n’ọnu-ọgugu aha.

54 Ndi bara uba ka i gēme ka ala-nketa-ha rie nne, ma ndi di ole-na-ole ka i gēme ka ala-nketa-ha di ntà; agēnye nwoke ọ bula ala-nketa-ya, dika ndi-ya agukọtara agukọta si di.

55 Nání ọ bu n’ife-nzà ka agēkè ala ahu: dika aha nile nke ebo nile nke ndi bu nna-ha si di ka ha gēketa.

56 Dika ife-nzà si di ka agēkè ihe-nketa-ha n’etiti ndi bara uba na ndi di ole-na-ole.

57 Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke ndi Livai dika ab͕uru nile ha si di: nke Giashon bu ab͕uru ndi Giashon: nke Kohat bu ab͕uru ndi Kohat: nke Merari bu ab͕uru ndi Merari.

58 Ndia bu ab͕uru Livai: ab͕uru ndi Libni, ab͕uru ndi Hebron, ab͕uru ndi Mahli, ab͕uru ndi Mushi, ab͕uru ndi Kora. Kohat we mua Amram.

59 Aha nwunye Amram bu Jokebed, nwa Livai, nke amuru ya nye Livai n’Ijipt: nwayi ahu we muara Amram Eron na Moses, na Miriam, bú nwa-nne-ha nwayi.

60 Amu-kwa-ra nye Eron Nebad na Abaihu na Eleeza na Itama.

61 Nedab na Abaihu we nwua mb͕e ha wetara nso n’iru Jehova ọku ala ọzọ.

62 Ndi-ha agukọtara agukọta di orú nnù uzọ abua, na nnù iri-na-asa, na ọgu iri nwoke ọ bula site n’onye ruru otù ọnwa we gaba n’iru: n’ihi na agukọtaghi ha n’etiti umu Israel, n’ihi na enyeghi ha ihe-nketa n’etiti umu Israel.

63 Ndia bu ndi Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, gukọtara; ndi gukọtara umu Israel n’ala ihe nādighi nke Moab n’akuku Jọdan na nso Jeriko.

64 Ma n’etiti ndia ọ dighi nwoke ọ bula di sitere na ndi Moses na Eron, bú onye-nchu-àjà, gukọtara; ndi gukọtara umu Israel n’ọzara Sainai.

65 N’ihi na Jehova kwuru okwu bayere ha, si, Ha aghaghi inwu n’ọzara nka. Ọ dighi kwa nwoke ọ bula fọduru nime ha, ma-ọbughi nání Keleb nwa Jefune na Joshua nwa Nun.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 27

1 Ha we biarue nso, bú umu-ndinyom Zelọfehad, nwa Hifa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase, nke ab͕uru Manase nwa Josef: ndia bu aha umu-ya ndinyom; Mahla, na Noa, na Họgla, na Milka, na Tiaza.

2 Ha we guzo n’iru Moses, na n’iru Eleeza, bú onye-nchu-aja, na n’iru ndi-isi na nzukọ Israel nile, n’ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, si,

3 Nna-ayi nwuru n’ọzara, ma ya onwe-ya adighi n’etiti nzukọ ahu ndi nēzukọ imegide Jehova nime nzukọ Kora: ma nime nmehie nke aka ya ka ọ nwuru: ma ọ dighi umu-ndikom o nwere.

4 N’ìhi gini ka agāgupu aha nna-ayi n’etiti ab͕uru-ya, n’ihi na o nweghi nwa-nwoke? Nye ayi ihe-onwunwe n’etiti umu-nne-nna-ayi ndikom.

5 Moses we weta ikpé-ha nso n’iru Jehova.

6 Jehova we gwa Moses okwu, si,

7 Ọ bu ihe ziri ezi ka umu-ndinyom Zelọfehad nēkwu: i ghaghi inye ha ihe-onwunwe nke ihe-nketa n’etiti umu-nne nna-ha ndikom; i gēme kwa ka ihe-nketa nna-ha gabiga rue ha aka.

8 Ọ bu kwa umu Israel ka i gāgwa okwu, si, Mb͕e nwoke gānwu, ma o nweghi nwa-nwoke, unu gēme kwa ka ihe-nketa-ya gabiga rue nwa-ya nwayi aka.

9 Ma ọ buru na o nweghi nwa-nwayi, unu gēnye kwa umunne-ya ndikom ihe-nketa-ya.

10 Ma ọ buru na ọ nweghi umu-nne-ndikom, unu gēnye kwa umu-nne nna-ya ndikom ihe-nketa-ya.

11 Ma ọ buru na nna-ya enweghi umu-nne-ndikom, unu gēnye kwa onye-aru-ya nke di ya nso site n’ab͕uru-ya ihe-nketa-ya, ọ gēnweta kwa ya: ọ gābu-kwa-ra umu Israel ukpuru ikpé, dika Jehova nyere Moses iwu.

12 Jehova we si Moses, Rigo n’ugwu Abarim nka, hu kwa ala ahu nke M’nyeworo umu Israel.

13 Ma mb͕e i huworo ya, agāchikọta kwa gi na umu-nna-gi n’ala-mọ, ọbuná gi onwe-gi, dika achikọtara Eron, bú nwa-nne-gi na umu-nna-ya:

14 n’ihi na unu nupuru isi n’okwu-ọnum n’ọzara Zin, n’ise-okwu ahu nke nzukọ Israel, bú nke M’gwara unu me, idom nsọ na miri ahu n’anya-ha (Miri ahu bu miri Meriba Kedesh n’ọzara Zin.)

15 Moses we gwa Jehova okwu, si,

16 Ka Jehova, bú Chineke nke mọ anu-aru nile, bú madu, nwere, Ya me otù nwoke ka ọ buru onye-nlekọta nzukọ a,

17 onye ganāpu apu n’iru ha, onye ganābà kwa abà n’iru ha, onye ganēme kwa ka ha nāpu apu, onye ganēme kwa ka ha nābà abà; ka nzukọ Jehova we ghara idi ka ìgwè ewu na aturu nke nēnweghi onye-ọzùzù.

18 Jehova we si Moses, Kuru n’onwe-gi Joshua nwa Nun, bú nwoke nke Mọm di nime ya, bikwasi ya aka-gi;

19 guzo kwa ya n’iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n’iru nzukọm nile; nye ya iwu n’anya-ha.

20 I gātukwasi kwa ya ufọdu nime ebube-gi, ka nzukọ nile nke umu Israel we nu.

21 Ọ bu kwa n’iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ka ọ gēguzo, onye gājuru ya ase n’ikpé Ìhe ahu n’iru Jehova: n’okwu-ọnu-ya ka ha ganāpu apu, ọ bu kwa n’okwu-ọnu-ya ka ha ganābà-abà, ya onwe-ya, na umu Israel nile tiyere ya, bú nzukọm nile.

22 Moses we me dika Jehova nyere ya iwu: o we kuru Joshua, guzo ya n’iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n’iru nzukọ Israel nile:

23 o we bikwasi ya aka-ya abua, nye kwa ya iwu, dika Jehova kwuru n’aka Moses.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 28

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Nye umu Israel iwu, si ha, Onyinyem iji biaru nso, nrim iji chu àjà-ọkum nile, bú ihe ísì utọ nkem, unu gēlezi anya iweta ya nsom na mb͕e-ya akara àkà.

3 I gāsi kwa ha, Nka bu àjà-ọku nke unu gēweta nso Jehova; umu-aturu abua nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè, kwa-ubọchi, ibu àjà-nsure-oku anēsure mb͕e dum.

4 Otù nime umu-aturu ahu ka i gāchu n’ututu, chu kwa nwa-aturu nke-ọzọ n’etiti ehihie na anyasi;

5 na otù uzọ n’uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara n’otù uzọ n’uzọ anọ nke otù hin nke manu asuru asu ka ọ buru onyinye-inata-iru-oma.

6 Ọ bu àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, nke emere n’ugwu Sainai ka ọ buru ihe ísì utọ, bú àjà-ọku anāchuru Jehova.

7 Àjà-ihe-ọṅuṅu-ya kwa, otú uzọ n’uzọ anọ nke otù hin gādiri otù nwa-aturu ahu: n’ebe nsọm ka i gāwusiri Jehova àjà-ihe-ọṅuṅu nke ihe-ọṅuṅu nāba n’anya.

8 Nwa-aturu nke-ọzọ ka i gāchu kwa n’etiti ehihie na anyasi: dika onyinye-inata-iru-ọma enyere n’ututu, na dika àjà-ihe-ọṅuṅu-ya, otú a ka i gēme ya, ibu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anēsurere jehova.

9 N’ubọchi-izu-ike kwa: umu-aturu abua nke b͕ara otú arọ, nke zuru oké, na uzọ abua n’uzọ iri nke otú ephah utu ọka flour ibu onyinye-inata-iru-oma, nke agwara manu, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya:

10 nka bu àjà-nsure-ọku ubọchi-izu-ike kwa-ubọchi-izu-ike, tiyere àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.

11 Ọzọ, na nmalite ọnwa-unu nile unu gēweta nso àjà-nsure-ọku isurere Jehova; umu-oke-ehi abua, na otù ebulu, na umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè;

12 na uzọ atọ n’uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour, bú onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, iji chu oke-ehi ọ bula; na uzọ abua n’uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour, bú onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, iji chu otù ebulu;

13 na otù uzọ n’uzọ iri, otù uzọ n’uzọ iri, nke otù ephah utu ọka flour, bú onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, iji chu nwa-aturu ọ bula; ọ bu àjà-nsure-ọku, ihe ísì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova.

14 Àjà-ihe-ọṅuṅu-ha gābu kwa nkera otù hin manya-vine iji chu otú oke-ehi, na otú uzọ n’uzọ atọ nke hin iji chu ebulu ahu, na otù uzọ n’uzọ anọ nke hin iji chu otù nwa-aturu: nka bu àjà-nsure-ọku ọnwa kwa-ọnwa anēsure n’ọnwa nile nke arọ.

15 Otù nkpi kwa iji chu àjà-nmehie nye Jehova; agāchu ya tiyere àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.

16 Ọzọ, n’ọwa mbu, n’ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa, ka ngabiga nke diri Jehova gādi.

17 N’ubọchi nke iri-na-ise nke ọnwa ahu ka ememe gādi: ubọchi asa ka agēri achicha ekoghi-eko.

18 N’ubọchi mbu nkpọkọta nsọ gādi; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje:

19 ma unu gēweta nso àjà-ọku, bú àjà nsure-ọku anēsurere Jehova; umu-oke-ehi abua, na otù ebulu, na umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ: nke zuru okè ka ha gāburu unu:

20 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, bú utu ọka flour agwara manu: uzọ atọ n’uzọ iri ka unu gāchu bayere otù oke-ehi, ọ bu kwa uzọ abua n’uzọ iri ka unu gāchu bayere ebulu ahu;

21 ọ bu kwa otù uzọ n’uzọ iri, otù uzọ n’uzọ iri, ka unu gāchu bayere nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu asa ahu;

22 na otù nkpi iji chu àjà-nmehie, ikpuchiri unu nmehie-unu.

23 Unu gāchu ndia nāgughi àjà-nsure-ọku ututu, nke bu àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum.

24 Dika ihe ndia si di ka unu ganāchu kwa-ubọchi, ubọchi asa, nri nke àjà-ọku, nke ihe ísì utọ anēsurere Jehova: agāchu ya tiyere àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na àjà ihe-ọṅuṅu-ya.

25 N’ubọchi nke-asa nkpọkọta nsọ gādi-kwa-ra unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.

26 Ọzọ, n’ubọchi nkpuru mbu, mb͕e unu nēweta nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma ọhu n’ememe izú asa nke ubọchi asa unu, nkpọkọta nsọ gādiri unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfufè unu gēje:

27 unu gēweta kwa nso àjà-nsure-ọku ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova; umu-oke-ehi abua, otù ebulu, umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ;

28 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, bú utu ọka flour agwara manu, uzọ atọ n’uzọ iri iji chu otù oke-ehi, uzọ abua n’uzọ iri iji chu otù ebulu ahu,

29 otù uzọ n’uzọ iri, otù uzọ n’uzọ iri, iji chu nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu asa ahu;

30 otú nkpi, iji kpuchiri unu nmehie-unu.

31 Unu gāchu ha nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, (nke zuru okè ka ha gāburu unu), na àjà-ihe-ọṅuṅu-ha.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 29

1 Ọzọ, n’ọnwa nke-asa, n’ubọchi mbu nke ọnwa ahu, nkpọkọta nsọ gādiri unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje: ubọchi uda-opì ka ọ gāburu unu.

2 Unu gēme àjà-nsure-ọku ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova; otù nwa-oke-ehi, otú ebulu, umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ nke zuru okè:

3 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, bú utu ọka flour agwara manu, uzọ atọ n’uzọ iri iji chu oke-ehi ahu, uzọ abua n’uzọ iri iji chu ebulu ahu,

4 na otù uzọ n’uzọ iri iji chu nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu asa ahu:

5 na otù nkpi iji chu àjà-nmehie, ikpuchiri unu nmehie-unu:

6 nāgughi àjà-nsure-ọku ọnwa ọhu, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, dika ikpé-ha si di, ibu ihe isì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova.

7 Ọzọ, n’ubọchi nke-iri nke ọnwa nke-asa nka nkpọkọta nsọ gādiri unu; unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n’ala; ọ dighi kwa ozi ọ bula unu gēje.

8 ma unu gēweta nso àjà-nsure-ọku isurere Jehova, bú ihe ísì utọ; otù nwa-oke-ehi, otù ebulu, umu-aturu asa nke b͕ara otú arọ; nke zuru okè ha gāburu unu:

9 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, bú utu ọka flour agwara manu, uzọ atọ n’uzọ iri iji chu otù ebulu ahu,

10 otù uzọ n’uzọ iri, otú uzọ iri, iji chu nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu asa ahu:

11 otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nmehie nkpuchi-nmehie, na àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha.

12 Ọzọ, n’ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa nke-asa nkpọkọta nsọ gādiri unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfufè unu gēje, unu gēme-kwa-ra Jehova ememe ubọchi asa:

13 unu gēweta kwa nso àjà-nsure-ọku, bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova; umu-oke-ehi iri na atọ, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ; nke zuru okè ka ha gābu:

14 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, utu ọka flour agwara manu, uzọ atọ n’uzọ iri iji chu oke-ehi ọ bula nime oke-ehi iri na atọ ahu, uzọ abua n’uzọ iri iji chu ebulu ọ bula nime ebulu abua ahu,

15 otù uzọ iri, otù uzọ n’uzọ iri, iji chu nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu iri na anọ ahu:

16 na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.

17 N’ubọchi nke-abua unu gēweta kwa nso umu-oke-ehi iri na abua, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè:

18 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi iri na abua ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu aturu ahu, n’ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:

19 na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha.

20 N’ubọchi nke-atọ kwa oke-ehi iri-na-otù, ebulu, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè;

21 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi iri na otù ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n’ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:

22 na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inatu-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.

23 N’ubọchi nke-anọ kwa oke-ehi iri, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè:

24 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha iji chu oke-ehi iri ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n’ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:

25 na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.

26 N’ubọchi nke-ise kwa oke-ehi iteghete, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otú arọ, nke zuru okè;

27 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha iji chu oke-ehi iteghete ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n’ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:

28 na otú nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.

29 N’ubọchi nke-isi kwa oke-ehi asatọ, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ zuru okè:

30 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi asatọ ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n’ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:

31 na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya nile.

32 N’ubọchi nke-asa kwa oke-ehi asa, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè:

33 na onyinye-inata-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi asa ahu, na iji ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n’ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:

34 na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.

35 N’ubọchi nke-asatọ nb͕ochi gādiri unu: ọ dighi ozi ọ bula nke òfufè unu gēje:

36 ma unu gēweta nso àjà-nsure-ọku. bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova:’ otú oke-ehi, otú ebulu, umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè:

37 onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-oṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi ahu, na iji chu ebulu ahu, na iji chu umu-aturu ahu, gādi n’ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:

38 na otù nkpi iji chu aja-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.

39 Ndia ka unu gēmere Jehova na mb͕e nile unu akara àkà, nāgughi nkwa nile unu, na onyinye-afọ-ofufo nile unu, iji chu àjà-nsure-ọku nile unu, na iji chu onyinye-inata-iru-ọma nile unu, na iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu nile unu, na iji chu àjà-udo nile unu.

40 Moses we gwa umu Israel okwu dika ihe nile nke Jehova nyere Moses n’iwu si di.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 30

1 Moses we gwa ndi-isi nke ebo nile nke umu Israel okwu, si, Nka bu ihe nke Jehova nyeworo n’iwu.

2 Nwoke ọ bula, mb͕e ọ gēkwe Jehova nkwa, ma-ọbu mb͕e ọ gāṅu iyi iwere isọ-nsọ ke nkpuru-obi-ya ab͕u, ọ gaghi-eme ka okwu-ya ghara idi nsọ; dika ihe nile si di nke nēsi n’ọnu-ya puta, otú a ka ọ gēme.

3 Nwayi kwa, mb͕e ọ gēkwe Jehova nkwa, were kwa isọ-nsọ ke onwe-ya ab͕u, n’ulo nna-ya, mb͕e ọ di na nwata;

4 nna-ya we nu nkwa-ya, na isọ-nsọ-ya o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, ma nna-ya b͕ara ya nkiti: nkwa-ya nile gēguzosi kwa ike, isọ-nsọ ọ bula nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u gēguzosi kwa ike.

5 Ma ọ buru na nna-ya si ya, É-è, n’ubọchi ọ nuru ya; ọ dighi ihe ọ bula nime nkwa-ya nile, ma-ọbu nime isọ-nsọ-ya nile nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, gēguzosi ike: Jehova gab͕aghara kwa ya, n’ihi na nna-ya si ya, É-è.

6 Ma ọ buru na nwoke alua ya na nwunye ma-ọli, mb͕e nkwa-ya nile dikwasi ya, ma-ọbu okwu efu ahu nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya, nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u;

7 di-ya we nu ya, ma ọ b͕ara ya nkiti n’ubọchi ọ nuru ya: nkwa-ya nile gēguzosi kwa ike, isọ-nsọ nile, nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, gēguzosi kwa ike.

8 Ma ọ buru na di-ya si ya, É-è, n’ubọchi ọ nuru ya; ọ gēmebi kwa nkwa-ya nke dikwasi ya, na okwu efu ahu nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya, nke o ji ke nkpuru-obi-ya: Jehova gāb͕aghara kwa ya.

9 Ma nkwa nke nwayi di-ya nwuru, ma-ọbu nke nwayi achupuru achupu, bú ihe ọ bula nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, o gēguzosi ike megide ya.

10 Ma ọ buru na ọ bu n’ulo di-ya ka o kwere nkwa, ma-ọbu were isọ-nsọ ke nkpuru-obi-ya ab͕u n’iṅu-iyi,

11 di-ya we nu ya, ma ọ b͕ara ya nkiti, ọ sighi kwa ya, É-è; nkwa-ya nile gēguzosi kwa ike, isọ-nsọ ọ bula nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u gēguzosi kwa ike.

12 Ma ọ buru na di-ya emebisia ha n’ubọchi ọ nuru ha; ihe ọ bula nke nēsi n’eb͕ub͕ere-ọnu-ya puta bayere nkwa-ya nile, ma-ọbu nke bayere isọ-nsọ nke nkpuru-obi-ya, ọ gaghi-eguzosi ike: di-ya emebiwo ha; Jehova gāb͕aghara kwa ya.

13 Nkwa ọ bula, na iyi isọ-nsọ ọ bula iji weda nkpuru-obi n’ala, di-ya gēme ka o guzosi ike, ma-ọbu di-ya gēmebi ya.

14 Ma ọ buru na di-ya ab͕achie ya nkiti site n’ubọchi rue ubọchi: o mewo kwa nkwa-ya nile, ma-ọbu isọ-nsọ-ya nile, nke dikwasi ya, ka ha guzosie ike: o mewo ka ha guzosie ike, n’ihi na ọ b͕ara ya nkiti n’ubọchi ọ nuru ha.

15 Ma ọ buru na o mebisia ha mb͕e ọ nusiri ha; ọ gēbu kwa ajọ omume nwayi ahu.

16 Ndia bu ukpuru, nke Jehova nyere Moses n’iwu. n’etiti nwoke na nwunye-ya, n’etiti nna na nwa-ya nwayi, mb͕e ọ di na nwata n’ulo nna-ya.