Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 11

1 Ndi Israel we di ka ndi nātamu ntamu, nēkwu ihe ọjọ na nti Jehova: Jehova we nu ya, iwe-Ya we di ọku; ọku nke Jehova we re n’etiti ha, we ripia madu ufọdu nime nsọtu ọmuma-ulo-ikwū.

2 Ndi Israel we tikue Moses; Moses we kpere Jehova ọku ahu we bilata.

3 Ewe kpọ aha ebe ahu Tabera: n’ihi na ọku nke Jehova nēre n’etiti ha.

4 Ìgwè ndi gwara ọgwa nke nọ n’etiti ha we chọ ajọ ọchichọ: umu Israel we kwa kwa ákwá ọzọ, si, Ònye gēme ka ayi rie anu?

5 Ayi nēcheta azù nke ayi nēri n’Ijipt nāzughi azú; ya na cucumbers na melons, na leeks, na onions, na garlic:

6 ma ub͕u a nkpuru-obi ayi akpọwo nku, ọ dighi ihe ọ bula ayi nwere: ọ bu nání manna nka di n’iru ayi.

7 Ma manna ahu, dika nkpuru coriander ka ọ bu, iru-ya di kwa ka iru bdellium.

8 Ndi Israel jeghariri, chikọta ya, were nkume-igwe-nri gwe ya, ma-ọbu na ha suru ya n’ikwè, we sie ya n’ite, me ya ka ọ buru ob͕e achicha: idetu ya ire ọ di ka idetu ihe eji manu si esi.

9 Mb͕e igirigi dakwasiri ọmuma-ulo-ikwū ahu n’abali, manna we dakwasi ya.

10 Moses we nu ndi Israel ka ha nākwa ákwá n’ab͕uru nile ha, nwoke ọ bula n’ọnu-uzọ ulo-ikwū-ya: iwe nke Jehova we di ọku nke-uku; ọ jọ-kwa-ra njọ n’anya Moses.

11 Moses we si Jehova, N’ìhi gini ka I ji mejọ orù-Gi? ọ̀ bu kwa n’ihi gini ka m’nāhutaghi kwa amara n’iru Gi, na I nēbom ibu nke ndi nka nile?

12 Ọ̀ bu mu onwem turu ime ndi nka nile? ọ̀ bu mu onwem muru ha, na I nāsim, Kuru ha n’obi-gi, dika nna-nāzù-nwa si eku nwa nāṅu ara, rue ala ahu nke I ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha?

13 Òle ebe m’gēsi nwe anu inye ndi nka nile? n’ihi na ha nākwasom ákwá, si, Nye ayi anu, ka ayi we rie.

14 Apughm, nání mu onwem, ikuru ndi nka nile, n’ihi na ọ karirim arọ́.

15 Ma ọ buru na otú a ka Gi onwe-gi nēmem, biko, gbuziem, ọ buru na ahutawom amara n’iru Gi; ka m’ghara kwa ilekwasi ihe ọjọm anya.

16 Jehova we si Moses, Chikọtaram ọgu ndikom atọ na iri sitere na ndi-okenye Israel, ndi i maworo na ha onwe-ha bu ndi-okenye nke ndi Israel, na ndi nēle ha anya n’ọlu: gi chiri ha bia rue ulo-ikwū nzute, ka ha we soro gi guzo onwe-ha n’ebe ahu.

17 M’gāridata, kpayere gi uka n’ebe ahu M’gānara kwa ufọdu nime Mọ ahu nke dikwasi gi, tukwasi ha; ha gēso kwa gi bū ibu ndi Israel, ka i we ghara ibū ya, nání gi onwe-gi.

18 Gi si kwa ndi Israel, Do onwe-unu nsọ bayere echi, unu gēri kwa anu: n’ihi na unu akwawo ákwá na nti Jehova, si, Ònye gēme ka ayi rie anu? n’ihi na ọ diri ayi nma n’Ijipt: Jehova gēnye kwa unu anu, unu gēri kwa.

19 Ọ bughi otù ubọchi ka unu gēri anu, ọ bughi ubọchi abua, ọ bughi ubọchi ise, ọ bughi ubọchi iri, ọ bughi orú ubọchi;

20 rue otù ọnwa zuru ezù, rue mb͕e o gēsi n’imi-unu puta, ọ we ghọrọ unu ihe-isọ-oyi: n’ihi na unu ajuwo Jehova Nke nọ n’etiti unu, unu we kwa ákwá n’iru Ya, si, N’ìhi gini kwa ka ayi siworo n’Ijipt puta?

21 Moses we si, Orú nnù ndikom ọgu uzọ atọ na orú nnù uzọ iri-na-ise ndi ji ukwu eje ka ndi ahu di, bú ndi mu onwem nọ n’etiti ha: ma Gi onwe-gi asiwo, Anu ka M’gēnye ha, ka ha we rie otù ọnwa zuru ezù.

22 Ọ̀ bu ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi ka agēb͕uru ha, ka o we zue ha? ọ̀ bu azù nile nke oké osimiri ka agāchikọtara ha, ka o we zue ha?

23 Jehova we si Moses, Aka Jehova, ọ̀ ghọwo nkpunkpu aka? ub͕u a ka i gāhu ma okwum gērere gi ma-ọbu na ọ gaghi-ere.

24 Moses we pua, gwa ndi Israel okwu nile nke Jehova: o we chikọta ọgu ndikom atọ na iri sitere na ndi-okenye nke ndi Israel, guzo ha buruburu Ulo-ikwū ahu.

25 Jehova we ridata n’igwe-oji ahu, gwa ya okwu, nara ufọdu nime Mọ ahu nke dikwasiri ya, tiyekwasi n’ọgu ndi-okenye atọ na iri ahu: o rue, mb͕e Mọ ahu bekwasiri ha, na ha buru amuma, ma ha emeghi ya ọzọ.

26 Ma ndikom abua fọduru n’ọmuma-ulo-ikwū, aha nke otù onye nime ha bu Eldad, aha nke ibe-ya bu Midad: Mọ ahu we bekwasi ha; ha onwe-ha di kwa n’etiti ndi edere aha-ha n’akwukwọ, ma ha apughi jerue Ulo-ikwū ahu: ha we bū amuma n’ọmuma-ulo-ikwū.

27 Otù okorọbia we b͕a ọsọ, gosi Moses, si, Eldad na Midad nēbu amuma n’ọmuma-ulo-ikwū.

28 Joshua nwa Nun, onye nējere Moses ozi, bú otù onye nime ndikom-ya arọputaworo, we za, si, Onye-nwem Moses, b͕ochie ha.

29 Moses we si ya, Ọ̀ bu onye nēkwo ekworo ka i burum? ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndi Jehova nile bu ndi-amuma ka Jehova we tiyekwasi ha Mọ-Ya!

30 Moses, ya na ndi-okenye Israel, we chikọta onwe-ha n’ọmuma-ulo-ikwū.

31 Otù ifufe we si n’ebe Jehova nọ bulie ije, we keputa nnunu quail n’oké osimiri, rapu ha n’akuku ọmuma-ulo-ikwū, dika ije otù ubọchi n’otù akuku, na dika ije otù ubọchi n’akuku. nke-ọzọ, buruburu ọmuma-ulo-ikwū, na dika cubit abua n’elu iru ala.

32 Ndi Israel we bilie ubọchi ahu nile, na abali-ya nile, na echi-ya nile, chikọta nnunu quail ahu: onye nāchikọta ntà chikọtara homer iri: ha we were ha b͕asara onwe-ha n’ebe nile buruburu-ọmuma-ulo-ikwū

33 Mb͕e anu ahu nādi n’etiti ezé-ha ub͕u a, tutu atabie ya, iwe Jehova we di ọku megide ndi Israel, Jehova we were ihe-otiti riri nne nke-uku tie ndi Israel.

34 Ewe kpọ aha ebe ahu Kibrot-hataava: n’ihi na n’ebe ahu ka ha lìri ndi Israel ndi nāchọ ajọ ọchichọ.

35 Ndi Israel siri na Kibrot-hataava bulie ije rue Hazerot; ha we nọ na Hazerot.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 12

1 Miriam na Eron we kwue okwu megide Moses n’ihi nwayi Etiopia ahu ọ lutara: n’ihi na nwayi Etiopia ka ọ lutara.

2 Ha we si, Ọ̀ bu ezie na nání Moses ka Jehova wereworo kwue okwu? Ọ̀ bughi kwa ayi ka o wereworo kwue okwu? Jehova we nu ya.

3 Ma nwoke ahu, bú Moses, di ume-ala n’obi nke-uku, kari madu nile ndi nọ n’elu ala.

4 Jehova we si Moses na Eron na Miriam na mberede, Putanu, unu atọ, rue ulo-ikwū nzute. Ha atọ we puta.

5 Jehova we ridata n’ogidi igwe-oji, guzo n’ọnu-uzọ Ulo-ikwū, kpọ Eron na Miriam: ha abua we puta.

6 Ọ we si Biko, nurunu okwum nile: ọ buru na onye-amuma di n’etiti unù, n’ọhu ka Mu, bú Jehova, gēme ka ọ maram, na nrọ ka M’gāgwa ya okwu.

7 Ọ bughi otú a ka orùm Moses di; n’ulom nile onye kwesiri ntukwasi-obi ka ọ bu

8 ọnu na ọnu ka M’gāgwa ya okwu ọbuná n’ile-anya, ọ bughi kwa n’ilu di iche iche; udi Jehova ka ọ gēlegide kwa anya: ọ̀ bu kwa gini mere unu nātughi egwu ikwu okwu megide orùm, bú imegide Moses?

9 Iwe Jehova we di ọku megide ha; Ọ we la.

10 Igwe-oji ahu we si n’elu Ulo-ikwū ahu wezuga onwe-ya; ma, le, Miriam bu onye ekpenta, dika snow; Eron we che Miriam iru, ma, le, ọ bu onye-ekpenta.

11 Eron we si Moses, Biko, onye-nwem, ariọm i, atukwasila ayi nmehie, nke ayi buru ndi-nzuzu nime ya, nke ayi mehiewo-kwa-ra nime ya.

12 Biko, ka ọ ghara idi ka onye nwuru anwu, nke nkera anu-aru-ya richapuworo mb͕e o si n’àkpà-nwa nne-ya puta.

13 Moses we tikue Jehova, si, Chineke, biko, me ka aru-ya di ike, biko.

14 Jehova we si Moses, Ọ buru na nna-ya ab͕asa ya asọ n’iru ma-ọli, ìhere agaghi-eme ya ubọchi asa? ka emechibido ya uzọ n’azu ọmuma-ulo-ikwū ubọchi asa, emesia agāchikọta kwa ya na ndi Israel.

15 Ewe mechibido Miriam uzọ n’azu ọmuma-ulo-ikwū ubọchi asa: ma ndi Israel ebulighi ije rue mb͕e achikọtara Miriam na ndi Israel.

16 Ma emesia ndi Israel siri na Hazerot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n’ọzara Peran.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 13

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Zigara onwe-gi ndikom, ka ha we ledo ala Kenean, nke Mu onwem nēnye umu Israel: otù nwoke otù nwoke diri ebo nna-ya-hà ka unu gēziga, onye ọ bula, ọ buru onye-isi n’etiti ha.

3 Moses we si n’ọzara Peran ziga ha n’okwu-ọnu Jehova: ha nile bu ndikom, ndi-isi umu Israel ka ha bu.

4 Ndia bu aha-ha: nke diri ebo Reuben bu Shamua nwa Zakua.

5 Nke diri ebo Simeon bu Shefat nwa Hori.

6 Nke diri ebo Juda bu Keleb nwa Jefune.

7 Nke diri ebo Isaka bu Igal nwa Josef.

8 Nke diri ebo Efraim bu Hoshia nwa Nun.

9 Nke diri ebo Benjamin bu Palti nwa Rafu.

10 Nke diri ebo Zebulun bu Gadiel nwa Sodi.

11 Nke diri ebo Josef, nke ahu bu, nke diri ebo Manase, bu Gadi nwa Susi.

12 Nke diri ebo Dan bu Amiel nwa Gemali.

13 Nke diri ebo Asha bu Setua nwa Maikael.

14 Nke diri ebo Naftali bu Nahbi nwa Vọfsi.

15 Nke diri ebo Gad bu Geuel nwa Maki.

16 Ndia bu aha ndikom ahu nke Moses zigara iledo ala ahu. Moses we kpọ Hoshia nwa Nun Joshua.

17 Moses we ziga ha iledo ala Kenean, ọ si ha, Rigonu n’uzọ a nime Negeb, rigo-kwa-nu n’ugwu:

18 we hu ala ahu, ihe ọ bu; na ndi ahu ndi bi na ya, ma ọ bu ndi di ike ka ha bu, ma-ọbu ndi nādighi ike, ma ọ bu madu ole-na-ole ka ha di, ma-ọbu ọtutu madu;

19 na ihe ala ahu bu nke ndi ahu nēbi nime ya, ma ọ bu ezi ala ka ọ bu ma-ọbu ala ọjọ; na ihe obodo nile bu nke ndi ahu nēbi nime ha, ma ọ bu na ha bi n’ọmuma-ulo-ikwū, ma-ọbu n’ebe ewusiri ike;

20 na ihe ala ahu bu, ma ọ bu ala nwere ume ka ọ bu ma-ọbu ala nātà ihe, ma osisi di nime ya, ma-ọbu na ọ dighi. Me kwa onwe-unu ka unu di ike, weta kwa ufọdu nime nkpuru ala ahu. Ma mb͕e ahu bu mb͕e nke nkpuru mbu nke nkpuru-vine.

21 Ha we rigo, ledo ala ahu site n’ọzara Zin rue Rehob, na nbata Hemat.

22 Ha we rigo nime Negeb, biarue Hebron; ma n’ebe ahu ka Ahiman na Sheshai na Talmai, bú umu Anak, nọ (Ma ewuru Hebron arọ asa tutu ewue Zoan n’Ijipt.)

23 Ha we biarue ndagwurugwu Eshkol, si n’ebe ahu b͕utu otù alaka na otù uyọkọ nkpuru-vine; ha we būru ya n’osisi eji ebu ihe n’etiti madu abua; ha weta-kwa-ra ufọdu nime nkpuru pomegranate na ufọdu nime nkpuru fig.

24 Akpọrọ ebe ahu ndagwurugwu Eshkol, n’ihi uyọkọ nke umu Israel si n’ebe ahu b͕utu.

25 Ha we si n’iledo ala ahu lata n’ọgwugwu ọgu ubọchi abua.

26 Ha we je biakute Moses, biakute kwa Eron, biakute kwa nzukọ nile nke umu Israel, rue ọzara Peran, rue Kedesh; we weghachiri ha na nzukọ Israel nile okwu, me kwa ka ha hu nkpuru ala ahu.

27 Ha we kọrọ ya akukọ, si Ayi bara n’ala ahu ebe i zigara ayi, ọzọ kwa, ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya ka ọ bu; nka bu kwa nkpuru-ya.

28 Otú ọ di, ndi bi n’ala ahu di ike, ewusi-kwa-ra obodo nile ha ike, ha di kwa uku ri nne: ọzọ kwa, umu Anak ka ayi huru n’ebe ahu.

29 Amalek bi n’ala Negeb; ndi Het na ndi Jebus na ndi-Amorait bi n’ugwu: ndi Kenean bi n’usọ oké osimiri, na n’akuku Jọdan.

30 Keleb we me ka ndi Israel b͕a nkiti n’ebe Moses nọ, ọ si, Ka ayi rigo nọ, nweta ya; n’ihi na ayi puru ime ya nke-ọma.

31 Ma ndikom ahu ndi soro ya rigo siri, Ayi apughi irigo imegide ndi ahu, n’ihi na ndi di ike ka ha bu kari ayi.

32 Ha we me ka akukọ ọjọ putara umu Israel bayere ala ahu nke ha ledoro, si, Ala ahu, nke ayi gabigaworo nime ya iledo ya, ala nke nēripia ndi bi ya ka ọ bu; ọzọ ndi nile ayi huru n’etiti ya bú ndikom toro ogologo.

33 N’ebe ahu ka ayi hu-kwa-ra ndi-Nefilim, bú umu Anak, ndi sitere na ndi-Nefilim: ayi we di n’anya onwe-ayi dika ogugu, ọ bu kwa otú a ka ayi di n’anya-ha.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 14

1 Nzukọ Israel nile we welie olu-ha, tie nkpu; ndi Israel we kwa ákwá abali ahu.

2 Umu Israel nile we tamue ntamu megide Moses, megide kwa Eron: nzukọ ahu nile we si ha, Ọ gādi ayi nọ nma ma asi na ayi anwuruwo n’ala Ijipt, ma-ọbu n’ọzara nka! ọ gādi ayi nọ nma ma asi na ayi anwuruwo!

3 Ọ̀ bu kwa n’ihi gini ka Jehova nēme ka ayi ba n’ala nka, ida site na mma-agha? Ndinyom-ayi na umu-ntakiri-ayi gāghọ ihe-nluta-n’agha: ọ̀ gaghi-adi ayi nma ilaghachi n’Ijipt?

4 Ha we sirita onwe-ha, Ka ayi me otù onye onye-isi, ka ayi laghachi kwa n’Ijipt.

5 Moses na Eron we da kpue iru-ha n’ala n’iru nkpọkọta nile nke nzukọ umu Israel.

6 Joshua nwa Nun na Keleb nwa Jefune, bú ndi sitere na ndi nēledo ala ahu, we dọwa uwe-ha:

7 ha we gwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, si, Ala ahu nke ayi gabigaworo nime ya iledo ya, ala ahu di nma nke-uku nke-uku.

8 Ọ buru na ihe ayi atọ Jehova utọ, Ọ gēme kwa ka ayi ba n’ala nka, Ọ gēnye kwa ayi ya; bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.

9 Nání, unu enupukwala isi n’aka Jehova, unu onwe-unu atu-kwa-la egwu ndi ala ahu; n’ihi na nri-ayi ka ha bu: ihe-nchegide-ha ewezugawo onwe-ya n’aru ha, ma Jehova nọyere ayi: unu atula egwu ha.

10 Nzukọ Israel nile we si ka ewere nkume tub͕ue ha. Ewe me ka umu Israel nile hu ebube Jehova anya n’ulo-ikwū nzute.

11 Jehova we si Moses, Rùe ole mb͕e ka ndi nka gēlelìm anya? ọ̀ bu kwa rue ole mb͕e ka ha nāgaghi-ekwe na Mu, n’ihi ihe-iriba-ama nile nke M’meworo n’etiti ha?

12 M’gēwere ajọ ọria nēfe efe tib͕ue ha, M’gānapu kwa ha ihe ha nwere, M’gēme kwa gi ka i ghọ mba di uku di kwa ike kari ha.

13 Moses we si Jehova, Ndi Ijipt gānu kwa ya; n’ihi na I were ike-Gi me ka ndi nka si n’etiti ha rigoputa;

14 ha gāgwa kwa ndi bi n’ala nka okwu a: ha anuwo na Gi onwe-gi, Jehova, nọ n’etiti ndi nka; n’ihi na anya na anya ka ahuworo Gi onwe-gi, Jehova, igwe-oji-Gi nēguzo kwa n’elu ha, ọ bu kwa n’ogidi igwe-oji ka Gi onwe-gi nēje ije n’iru ha n’ehihie, na n’ogidi ọku n’abali.

15 Ma asi na I me ka ndi nka nwua dika otù onye, mba nile ndi nuworo akukọ bayere Gi gēkwu kwa, si,

16 N’ihi na Jehova apughi ime ka ndi nka ba n’ala ahu nke Ọ ṅuru ha iyi inye ha, n’ihi ya ka O b͕uworo ha n’ọzara.

17 Ma ub͕u a, biko, ka ike Onye-nwe-ayi di uku, dika I kwuworo, si,

18 Jehova adighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba uba n’ebere, Ọ nāb͕aghara kwa ajọ omume na njehie, ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmaghi; Ọ nēwere kwa ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ.

19 Biko, b͕aghara ajọ omume nke ndi nka dika idi-uku nke ebere-Gi si di, na dika I b͕agharaworo ndi nka, site n’Ijipt we rue ub͕u a.

20 Jehova we si, Ab͕agharawom dika okwu-gi si di:

21 ma otù ọ di, Mu onwem nādi ndu, uwa nile gējuputa kwa n’ebube Jehova;

22 n’ihi na ndikom ahu nile ndi huworo ebubem, na ihe-iriba-amam nile, nke M’meworo n’Ijipt na n’ọzara, ma ha nwaworom ub͕ò iri a, ha egeghi kwa olum nti;

23 ha agaghi-ahu ala ahu ma-ọli nke M’ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha, ndi nile nke nēlelìm anya agaghi-ahu kwa ya:

24 ma orùm Keleb, n’ihi na mọ di iche nọ n’ime ya, n’ihi kwa na o nēsozum n’azu, M’gēme kwa ka ọ ba n’ala ahu ebe ọ bara; nkpuru-ya gēnweta kwa ya.

25 Ma ndi Amalek na ndi Kenean bi na ndagwurugwu a: echi chigharianu, buli-kwa-ra onwe-unu ije je n’ọzara n’uzọ Oké Osimiri Uhie.

26 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,

27 Rùe ole mb͕e ka M’gānagide nzukọ ọjọ nka nke nātamu ntamu megidem? ntamu nile nke umu Israel, nke ha onwe-ha nātamu megidem, ka M’nuworo.

28 Si ha, Mu onwem nādi ndu, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta, dika unu kwuworo na ntim, otú a ka M’nāghaghi ime unu:

29 n’ọzara nka ka ozu-unu ga-ada; ndi-unu nile agukọtara agukọta, dika ọnu-ogugu nile unu si di, site n’onye b͕ara orú arọ we gaba n’iru, ndi tamuworo ntamu megidem,

30 unu onwe-unu agaghi-abà n’ala ahu ma-ọli, nke M’buliri akam ime ka unu biri nime ya, ma-ọbughi Keleb nwa Jefune na Joshua nwa Nun.

31 Ma umu-ntakiri-unu, ndi unu siri na ha gāghọ ihe-nluta-n’agha, M’gēme kwa ka ha ba, ha gāma kwa ala ahu nke unu juru aju.

32 Ma unu onwe-unu, ozu-unu gāda n’ọzara nka.

33 Umu-unu gābu kwa ndi-ọzùzù-aturu n’ọzara ọgu arọ abua, ha gēbu kwa ọkwukwa-iko nile unu, rue mb͕e ozu-unu gāgwusi n’ọzara.

34 Dika ọnu-ọgugu ubọchi nke unu ji ledo ala ahu anya si di, bú ọgu ubọchi abua, otù ubọchi otù arọ, otù ubochi otù arọ, otù a ka unu gēbu ajọ omume nile unu, ọgu arọ abua, unu gāma kwa iju-ajum.

35 Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo, nka ka M’nāghaghi imere nzukọ ọjọ a nile, ndi nēzukọ imegidem: n’ọzara nka ka ha gāgwusi, ọ bu kwa n’ebe ahu ka ha gānwu.

36 Ma ndikom ahu, ndi Moses zigara iledo ala ahu, ndi lata-kwa-ra, me ka nzukọ Israel nile tamu ntamu megide Ya, n’ime ka akukọ ọjọ bayere ala ahu puta,

37 ọbuná ndikom ahu, bú ndi nēme ka akukọ ọjọ bayere ala ahu puta, nwuru n’ihe-otiti ahu n’iru Jehova.

38 Ma Joshua nwa Nun na Keleb nwa Jefune di ndu site na ndikom ahu ndi jeworo iledo ala ahu.

39 Moses we gwa umu Israel nile okwu ndia: ndi Israel we rue újú nke-uku.

40 Ha we bilie n’isi-ututu, rigorue elu ugwu ahu, si, Le ayi, Le ayi, ayi gārigoru kwa ebe ahu nke Jehova kwuru okwu bayere ya: n’ihi na ayi emehiewo.

41 Moses we si, N’ìhi gini kwa ka unu onwe-unu nāgabiga okwu-ọnu Jehova? ma nke ahu agaghi-aga nke-ọma.

42 Unu arigola, n’ihi na Jehova anọghi n’etiti unu; ka ewe ghara itib͕u unu n’iru ndi-iro-unu.

43 N’ihi na ndi Amalek na ndi Kenean nọ n’ebe ahu n’iru unu, unu gāda kwa site na mma-agha: n’ihi na unu esiwo n’iso Jehova laghachi, n’ihi ya Jehova agaghi-anọyere unu.

44 Ma ha were npako rigorue elu ugwu ahu: ma ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, na Moses, esighi n’etiti ọmuma-ulo-ikwū pua.

45 Ndi Amalek we ridata, ha na ndi Kenean, bú ndi bi n’ugwu ahu, ha we tib͕ue ha, tipia kwa ha rue Họma.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 15

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu gābà n’ala ebe-obibi nile unu, nke Mu onwem nēnye unu,

3 mb͕e unu gēme kwa àjà-ọku ichuru Jehova, bú àjà-nsure-ọku, ma-ọbu àjà ọzọ, imezu nkwa, ma-ọbu n’onyinye-afọ-ofufo, ma-ọbu na mb͕e nile unu akara àkà, ime ihe ísì utọ isurere Jehova, sitere n’ìgwè ehi, ma-ọbu n’ìgwè ewu na aturu:

4 onye ahu nke nēweta nso onyinye-ya iji biaru nso gēweta kwa nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma, bú otù uzọ n’uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara n’otù uzọ n’uzọ anọ nke otù hin nke manu:

5 manya-vine iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu, otù uzọ n’uzọ anọ nke hin, tiyere àjà-nsure-ọku ahu, ma-ọbu iji chu àjà ọzọ ahu, ka i gēdoziri otù nwa-aturu.

6 Ma-ọbu n’ichu ebulu n’àjà, i gēdozi onyinye-inata-iru-ọma, uzọ abua n’uzọ iri nke otù ephah utu ọku flour agwara n’otù uzọ n’uzọ atọ nke otù hin nke manu.

7 Manya-vine iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu, otù uzọ n’uzọ atọ nke otù hin, ka i gēweta kwa nso, ka ọ buru ihe ísì utọ isurere Jehova.

8 Ọzọ, mb͕e i nēme nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ma-ọbu àjà ọzọ, imezu nkwa, ma-ọbu ichu àjà-udo anāchuru Jehova:

9 ọ gēweta kwa nso, tiyere nwa-oke-ehi ahu, onyinye-inata-iru-ọma, bú uzọ atọ n’uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara na nkera hin nke manu.

10 Manya-vine ka i gēweta kwa nso iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu, nkera hin, ka ọ buru àjà-ọku nke ihe ísì utọ isurere Jehova.

11 Otú a ka agēmere otù oke-ehi, ma-ọbu otù ebulu, ma-ọbu otù nwa nime aturu ma-ọbu nime ewu.

12 Dika ọnu-ọgugu ihe nke unu nēdozi si di, otú a ka unu gēmere ihe ọ bula dika ọnu-ọgugu-ha si di.

13 Onye ọ bula amuru n’ala gēme ihe ndia otú a, n’iweta nso àjà-ọku nke ihe ísì utọ isurere Jehova.

14 ọzọ mb͕e ọbìa nọ n’ala-unu dika ọbìa, ma-ọbu onye ọ bula nọ n’etiti unu rue ọb͕ọ nile unu, mb͕e ọ gēme àjà-ọku nke ihe ísì utọ anēsurere Jehova; dika unu si eme, otú a ka ọ gēme.

15 Nime nkpọkọta nka, otù ukpuru diri unu, di-kwa-ra ọbìa nke nọ dika ọbìa, bú ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ nile unu: dika unu si di, otú a ka ọbìa ahu gādi n’iru Jehova.

16 Otù iwu na otù ikpé gādiri unu, di-kwa-ra ọbìa nke nọ dika ọbìa n’ala-unu.

17 Jehova we gwa Moses okwu, si,

18 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu gābà n’ala ahu ebe Mu onwem nēme ka unu ba,

19 ọ gēru kwa, mgbe unu nēri nime nri ala ahu, na unu gēbuliri Jehova àjà-nbuli.

20 Ob͕e achicha nke utu ọka mbu unu ka unu gēbuli, ka ọ buru àjà-nbuli: dika àjà-nbuli nke ebe-nzọcha-ọka, otú a ka unu gēbuli ya.

21 Site n’utu ọka mbu unu unu gēnye Jehova àjà-nbuli rue ọb͕ọ nile unu.

22 Ọzọ, mb͕e unu gēme ihe n’amaghi-ama, ghara kwa ime ihe ndia nile enyere n’iwu, nke Jehova gwaworo Moses,

23 bú ihe nile nke Jehova nyere unu n’iwu n’aka Moses, site n’ubọchi nke Jehova nyere iwu, we gaba n’iru rue ọb͕ọ nile unu;

24 ọ gēru kwa, ma ọ buru na emewo ya n’amaghi-ama, n’ebe anya nzukọ Israel nērughi, na nzukọ ahu nile gēme otù nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova, ya na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-Ihe-ọṅuṅu-ya, dika ikpé-ya si di, na otù nkpi iji chu àjà-nmehie.

25 Onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra nzukọ nile nke umu Israel nmehie-ha, agāb͕aghara kwa ha; n’ihi na amaghi-ama ka ọ bu, ha onwe-ha ewetawo kwa nso onyinye-ha iji biaru nso, bú àjà-ọku ichuru Jehova, na àjà-nmehie-ha n’iru, Jehova, n’ihi amaghi-ama-ha:

26 agāb͕aghara kwa nzukọ nile nke umu Israel, ha na ọbìa nke nọ dika ọbìa n’etiti ha; n’ihi na n’ebe ndi Israel nile nọ emere ya n’amaghi-ama.

27 Ma ọ buru na otù onye emehie n’amaghi-ama, ọ gēweta kwa nso nne-ewu nke b͕ara otù arọ iji chu àjà-nmehie.

28 Onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra nkpuru-obi ahu nmehie-ya, bú nke nēme ihe n’amaghi-ama, mb͕e ọ nēmehie n’amaghi-ama, n’iru Jehova, ikpuchiri ya nmehie-ya; agāb͕aghara kwa ya.

29 Ma onye amuru n’ala n’etiti umu Israel, ma ọbìa nke nọ dika ọbìa n’etiti ha, otù iwu ka unu gēnwe bayere onye nēme ihe n’amaghi-ama.

30 Ma nkpuru-obi ahu nke nēwere aka npako me ihe, ma ọ bu onye amuru n’ala ma-ọbu ọbìa, Jehova ka onye ahu nēkwulu; agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n’etiti ndi-ya.

31 N’ihi na ọ bu okwu Jehova ka ọ lelíworo anya, n’ihi kwa na ọ bu ihe O nyere n’iwu ka o mebiworo; agēbipu nkpuru-obi ahu ebipu, ajọ omume-ya gādikwasi ya.

32 Umu Israel we nọ n’ọzara, ha we huta otù nwoke ka ọ nāchikọta nkú n’ubọchi-izu-ike.

33 Ndi hutara ya ka ọ nāchikọta nkú we me ka ọ biakute Moses na Eron na nzukọ Israel nile.

34 Ha we me ka ọ nọdu n’ebe anēdebe ndi-nkpọrọ, n’ihi na agwaghi ha ihe banyere ya, bú ihe agēme ya.

35 Jehova we si Moses, Aghaghi ime ka nwoke ahu nwua: nzukọ Israel nile gēwere nkume tub͕ue ya n’azu ọmuma-ulo-ikwū.

36 Nzukọ ahu nile we me ka ọ pua je n’azu ọmuma-ulo-ikwū, ha we were nkume tub͕ue ya, ọ we nwua; dika Jehova nyere Moses iwu.

37 Jehova we gwa Moses okwu, si,

38 Gwa umu Israel okwu, si ha mere onwe-ha ọnu-ọnu n’elu usọ uwe-ha rue ọb͕ọ nile ha, tiyekwasi kwa n’ọnu-ọnu nke usọ uwe ahu eriri-nma ogho anunu:

39 ọ gābu-kwa-ra unu ọnu-ọnu usọ uwe, ka unu we hu ya anya, we cheta ihe nile Jehova nyere n’iwu, me kwa ha; ka unu we ghara kwa iledo otú unu gēso obi-unu, otú unu gēso kwa anya-unu, nke unu onwe-unu nēso ha ikwa iko:

40 ka unu we cheta me kwa ihe nile M’nyere n’iwu, buru kwa ndi diri Chineke-unu nsọ.

41 Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n’ala Ijipt puta, ka M’we buru unu Chineke: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 16

1 Ma Kora, nwa Izha, nwa Kohat, nwa Livai, ya na Detan na Abairam, umu Eliab, na On, nwa Pelet, bú umu Reuben, chiri ndikom:

2 ha we bilie n’iru Moses, ha na ndikom ufọdu ndi sitere n’umu Israel, ọgu ndi isi nzukọ iri-na-abua na iri, ndi akpọrọ ibia na nzute, ndikom amara aha-ha:

3 ha we kpọkọta onwe-ha imegide Moses na imegide Eron, si ha, O zuworo unu, n’ihi na nzukọ Israel nile, ha nile n’otù n’otù, di nsọ, ọ bu kwa n’etiti ha ka Jehova nọ: ọ̀ bu kwa gini mere unu nēbuli onwe-unu kari nkpọkọta nke Jehova?

4 Moses we nu ya, we da kpue iru-ya n’ala:

5 o we gwa Kora, gwa kwa nzukọ-ya nile, okwu, si, N’ututu Jehova gēme ka amara ndi O nwere, na onye di nsọ, na onye Ọ gēme ka ọ biarue nso Ya: Onye Ọ gārọputa, onye ahu ka Ọ gēme kwa ka ọ biarue nso Ya.

6 Menu nka; chirinu n’onwe-unu ihe-igu-ọku, Kora, na nzukọ-ya nile;

7 tiye-kwa-nu ọku nime ha, tukwasi kwa n’elu ha ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’iru Jehova echi: ọ gēru kwa na nwoke ahu nke Jehova gārọputa, onye ahu bu onye nsọ: o zuworo unu, umu Livai.

8 Moses we si Kora, Biko, nurunu, umu Livai:

9 Ọ̀ bu unu ihe ntà na Chineke nke Israel akpawo ókè n’etiti unu na nzukọ Israel, ime ka unu biarue nso Ya; ifè òfùfè nke ebe-obibi Jehova, na iguzo n’iru nzukọ ahu ijere ha ozi;

10 Ọ we me ka i biarue nso, gi na umu-nne-gi niile, bú umu Livai? ùnu nācho kwa ọlu nchu-àjà?

11 N’ihi ya gi onwe-gi na nzukọ-gi nile bu ndi nēzukọ imegide Jehova: ma Eron, gini ka ọ bu na unu nātamu ntamu megide ya?

12 Moses we ziga ikpọ Detan na Abairam, bú umu Eliab: ha we si, Ayi agaghi-arigo:

13 ọ̀ bu ihe ntà na i mewo ka ayi si n’ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya rigoputa, ime ka ayi nwua n’ọzara nka, ma i ghaghi ime kwa onwe-gi onye-isi-ayi?

14 Ọzọ kwa, ọ bughi ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nēru nime ya ka i meworo ka ayi ba, i nyeghi kwa ayi ihe-nketa, bú ubi na ubi-vine: ì gārukpọ anya ndikom ndia? ayi agaghi-arigo.

15 Moses we we iwe di ọku nke-uku, ọ we si Jehova, Echela onyinye-inata-iru-ọma-ha iru: ọ dighi otù inyinya-ibu m’naraworo n’aka-ha, ọ dighi kwa otù onye nime ha M’mejọworo.

16 Moses we si Kora, Gi onwe-gi na nzukọ-gi nile nọ n’iru Jehova, gi, na ha, na Eron, echi:

17 chiri-kwa-nu, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya, tiye kwa ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n’elu ha, weta kwa-nu ha nso n’iru Jehova, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya, ọgu ihe-igu-ọku iri-na-abua na iri; gi onwe-gi kwa, na Eron, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya.

18 Ha we chiri, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya, tiye ọku n’elu ha, tukwasi kwa ha ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, we guzo n’ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, ha na Moses na Eron.

19 Kora we kpọkọta nzukọ Israel nile megide ha rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute: ewe me ka nzukọ ahu nile hu ebube Jehova anya.

20 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,

21 Kewapunu onwe-unu n’etiti nzukọ nka, ka M’we me ka ha gwusia dika n’otù ntabi-anya.

22 Ha we da kpue iru-ha n’ala, si, Chineke, bú Chineke nke mọ nile na anu-aru nile, bú madu, nwere, asi na otú nwoke emehie, Ì gēwesa kwa nzukọ a nile iwe?

23 Jehova we gwa Moses okwu, si,

24 Gwa nzukọ Israel okwu, si, Sinu na buruburu ebe-obibi nke Kora na Detan na Abairam rigo.

25 Moses we bilie, jekuru Detan na Abairam; ndi-okenye Israel we so ya.

26 o we gwa nzukọ Israel okwu, si, Biko, sinu n’ulo-ikwū ndikom ndia, bú ndi nēmebi iwu, wezuga onwe-unu, unu emetu-kwa-la ihe ọ bula ha nwere, ka ewe ghara ikpochapu unu nime nmehie-ha nile.

27 Ha we si n’ebe-obibi nke Kora na Detan na Abairam buruburu rigo: Detan na Abairam we puta, guzo onwe-ha n’ọnu-uzọ ulo-ikwū-ha, ha na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ntakiri-ha.

28 Moses we si, Na nka ka unu gāmara na Jehova ezitewom ime omume ndia nile; n’ihi na ha esiteghi n’obim.

29 Ọ buru na ọnwu dika ọnwu madu nile ka ndia gānwu, ọ buru kwa na ọ bu nleta madu nile ka aga eleta ha; Jehova eziteghm.

30 Ma ọ buru na ihe-òkìkè ọhu ka Jehova gēkè, ala ewe saghepu ọnu-ya, loda ha, ha na ihe nile ha nwere, ha we rida na ndu rue ala-mọ; unu gāmara kwa na ndikom ndia elelìwo Jehova.

31 O rue, mb͕e o kwubiri okwu ndia nile, na ala nke di n’okpuru ha b͕awara:

32 ala we saghe ọnu-ya, loda ha, na ulo nile ha, na madu nile Kora nwere, na àkù-ha nile.

33 Ha we rida na ndu rue ala-mọ, ha onwe-ha na ihe nile ha nwere: ala we mechie n’elu ha, ha we si n’etiti nkpọkọta ahu la n’iyì.

34 Israel nile ndi nọ ha buruburu we b͕alaga n’olu ákwá-ha: n’ihi na ha siri, Ka ala we ghara iloda ayi.

35 Ọku we si n’ebe Jehova nọ puta, ripia ọgu ndikom iri-na-abua na iri ahu nēweta nso ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

36 Jehova we gwa Moses okwu, si,

37 Gwa Eleeza nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, ka o si n’etiti nsure-ọku ahu chilie ihe-igu-ọku ahu, gi kposa kwa ọku ahu n’akuku ahu; n’ihi na ha di nsọ;

38 bú ihe-igu-ọku nke ndi-nmehie ndia ndi megidere nkpuru-obi-ha, ka ewere kwa ha kpu mbadamba ihe ibu ihe-nmachita diri ebe-ichu-àjà: n’ihi na ha wetara ha nso n’iru Jehova, ha di kwa nsọ: ha gābu-kwa-ra umu Isael ihe-iriba-ama.

39 Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we chiri ihe-igu-ọku ọla ahu, nke ndi ahu esurere ọku wetara nso, ha we tisa ha ka ha buru ihe-nmachita diri ebe-ichu-àjà:

40 iburu umu Israel ihe-ncheta, ka nwoke ala ọzọ onye nēsiteghi na nkpuru Eron, we ghara ibia nso isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’iru Jehova; ka ọ ghara idi ka Kora, di kwa ka nzukọ-ya: dika Jehova gwara ya okwu n’aka Moses.

41 Ma nzukọ nile nke umu Israel tamuru ntamu n’echi-ya megide Moses megide kwa Eron, si, Unu onwe-unu emewo ka ndi nke Jehova nwua.

42 O rue, mb͕e akpọkọtara nzukọ ahu megide Moses megide kwa Eron, na ha chere iru n’ulo-ikwū nzute: ma, le, igwe-oji ahu kpuchiri ya, ewe hu ebube Jehova.

43 Moses na Eron we bia n’iru ulo-ikwū nzute.

44 Jehova we gwa Moses okwu, si,

45 Sinu n’etiti nzukọ a bilie, ka M’we me ka ha gwusia dika n’otù ntabi-anya. Ha we da kpue iru-ha n’ala.

46 Moses we si Eron, Were ihe-igu-ọku-gi, tiye ọku n.elu-ya sitere n’elu ebe-ichu-àjà, tukwasi kwa ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, būru ya jekuru nzukọ Israel ngwa ngwa, kpuchiere ha nmehie-ha; n’ihi na iwe ahu esiwo n.iru Jehova puta; ihe-otiti ahu amalitewo.

47 Eron we were dika Moses kwuru, b͕abà n’etiti nkpọkọta ahu; ma, le, ihe-otiti ahu amalitewo n’etiti ndi Israel: ọ we tiye ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ, we kpuchiere ndi ahu nmehie-ha.

48 Ọ we guzo n’etiti ndi nwuru anwu na ndi di ndu, ewe b͕ochie ihe-otiti ahu.

49 Ma ndi nwuru anwu n’ihe-otiti ahu di orú nnù na nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-ise, nāgughi ndi nwuru anwu n’okwu Kora.

50 Eron we laghachikuru Moses rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute: ewe b͕ochie ihe-otiti ahu.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 17

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Gwa umu Israel okwu, nara kwa n’aka-ha nkpa-n’aka nkpa-n’aka, otù diri otù ulo nna, n’aka ndi-isi ha nile, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, nkpa-n’aka iri-na-abua: aha nwoke ọ bula ka i gēdekwasi na nkpa-n’aka-ya

3 Ma aha Eron ka i gēdekwasi na nkpa-n:aka Livai: n’ihi na ọ bu otù nkpa-n’aka ka onye-isi ọ bula nke ulo nke ndi bu nna-ha gēnwe.

4 I gēdo kwa ha n’ulo-ikwū n’iru ihe-àmà ahu, ebe Mu na unu nēzute.

5 O gēru kwa, na nwoke ahu nke M’gārọputa, nkpa-n’aka-ya gāma ifuru: M’gēme kwa ka ntamu nile nke umu Israel si n’arum bìe, bú nke ha onwe-ha nātamu megide unu.

6 Moses we gwa umu Israel okwu, ndi-isi-ha nile we nye ya nkpa-n’aka, otù onye-isi otù nkpa-n’aka, otù onye-isi otù nkpa-n’aka, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di nkpa-n’aka iri na abua: nkpa-n’aka Eron di kwa n.etiti nkpa-n’aka-ha.

7 Moses we do nkpa-n’aka nile n’iru Jehova n’ulo-ikwū nke ihe-àmà.

8 O rue n’echi-ya, na Moses bara n’ulo-ikwū nke ihe-àmà; ma, le, nkpa-n’aka Eron nke diri ulo Livai amawo ifuru, b͕awa kwa ifuru ahu, wa kwa okoko, mì kwa almond chara acha.

9 Moses we si n’iru Jehova chiputara umu Israel nile nkpa-n’aka ahu nile: ha we le anya, were ha, nwoke ọ bula nkpa-n’aka-ya.

10 Jehova we si Moses, Doghachi nkpa-n’aka Eron n’iru ihe-àmàm ka ọ buru ihe-ndebe, iburu umu nnupu-isi ihe-iriba-ama; ka i we me ka ntamu nile ha si n’ebe M’nọ bìsia, ka ha we ghara inwu.

11 Moses we me ya: dika Jehova nyere ya iwu, otú a ka ọ mere.

12 Umu Israel we gwa Moses okwu, si, Le, ayi ekubìwo, ayi alawo n’iyì, ayi nile alawo n’iyì.

13 Onye ọ bula nke nābiaru nso, nke nābiaru nso ebe-obibi Jehova, gānwu: ọ̀ bu na ayi agwusiwo n’ikubì ekubì?

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 18

1 Jehova we si Eron, Gi onwe-gi na umu-gi ndikom na ulo nna-gi tiyere gi gēbu ajọ omume nke ebe nsọm: gi onwe-gi na umu-gi ndikom tiyere gi gēbu kwa ajọ omume nke ọlu-nchu-àjà-unu.

2 Ọzọ kwa, umu-nne-gi, bú ebo Livai, ebo nna-gi, gi me ka ha soro gi biaru nso, ka ha we rapara n’aru-gi, nēje-kwa-ra gi ozi: ma gi onwe-gi na umu-gi ndikom tiyere gi gānọ n’iru ulo-ikwū ihe àmàm.

3 Ha gēdebe kwa ihe-ndebe-gi, na ihe-ndebe nke Ulo-ikwūm nile: nání na ha agaghi-abiaru nso ihe nile nke ebe nsọm, ha agaghi-abiaru kwa nso ebe-ichu-àjàm, ka ha we ghara inwu, ma ha, ma unu.

4 Ha gārapara kwa n’aru-gi, debe kwa ihe-ndebe nke ulo-ikwū nzute, nke diri òfùfè nile nke Ulo-ikwū ahu: ma onye ala ọzọ agaghi-abiaru nso unu.

5 Unu gēdebe kwa ihe-ndebe nke ebe nsọm, na ihe-ndebe nke ebe-ichu-àjàm: ka iwe we ghara idikwasi umu Israel ọzọ.

6 Ma Mu onwem, le, esiwom n’etiti umu Israel were umu-nne-gi, bú ndi Livai: ha buru onyinye, ndi enyere Jehova, ifè òfùfè nke ulo-ikwū nzute.

7 Ma gi onwe-gi na umu-gi ndikom tiyere gi gēdebe ọlu-nchu-àjà-unu bayere ihe nile nke ebe-ichu-àjàm, baye-kwa-ra ihe di nime ákwà-nb͕ochi; unu gēfè kwa: dika òfùfè nke onyinye ka M’nēnye unu ọlu-nchu-àjà-unu: ma onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.

8 Jehova we gwa Eron okwu, si, Ma Mu onwem, le, enyewom i ihe-ndebe nke àjà-nbulim nile, bú nke diri ihe nile edoro nsọ nke umu Israel, gi ka M’nyeworo ha ibu òkè otite-manu, nye kwa umu-gi ndikom, n’ukpuru ebighi-ebi.

9 Nka gābu nke gi site n’ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, site n’ọku: onyinye-ha ọ bula iji biaru nso, ọbuná onyinye-inata-iru-ọma-ha ọ bula, na àjà-nmehie-ha ọ bula, na àjà-ikpe-ọmuma-ha ọ bula, nke ha gēnyeghachim, ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ gāburu gi, buru kwa umu-gi ndikom.

10 N’ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka i gēri ya: nwoke ọ bula gēri ya; ihe nsọ ka ọ gāburu gi.

11 Nka bu kwa nke gi, àjà-nbuli nke onyinye-ha, ọbuná-àjà-ofufé nile nke umu Israel: gi ka M’nyeworo ha, nye kwa umu-gi ndikom, nye kwa umu-gi ndinyom, tiyere gi, n’ukpuru ebighi-ebi onye ọ bula nke di ọcha n’ulo-gi gēri ya.

12 Manu nile nke kachasi nma nke manu ọhu, na manya nile nke kachasi nma nke manya-vine ọhu, na ọka, bú ihe mbu ha nke ha nēnye Jehova, gi ka M’nyeworo ha.

13 Nkpuru mbu nke ihe nile di n’ala-ha, nke ha nēwetara Jehova, nke gi ka ọ bu; onye ọ bula nke di ọcha n’ulo-gi gēri ya.

14 Ihe ọ bula ewezugara ka ebibie ya n’Israel, nke gi ka ọ bu.

15 Nwa ọ bula nke meghere àkpà-nwa, nke anu-aru nile nke ha nēweta nso Jehova, n’etiti madu na n’etiti anu-ulo, ọ bu nke gi: nání i ghaghi ib͕aputa nwa madu buru uzọ mu, nwa anu-ulo ruru árú buru uzọ mu ka i gāb͕aputa kwa.

16 Ma ndi-ha anāb͕aputa site na nke ruru otù ọnwa ka i gāb͕aputa, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, n’ọla-ọcha shekel ise, dika shekel nke ebe nsọm si di (orú gerah ka ọ bu).

17 Ma otú ọ di, nwa ehi buru uzọ mu, ma-ọbu nwa aturu buru uzọ mu, ma-ọbu nwa ewu buru uzọ mu, i gaghi-ab͕aputa ha; ihe nsọ ka ha bu: i gāwusa ọbara-ha n’ebe-ichu-àjàm, sure kwa abuba-ha ọku ibu ihe nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ buru àjà-ọku, ime ihe ísì utọ anēsurere Jehova.

18 Anu-ha bu kwa nke gi, dika okpukpu-obi nke àjà-ofufé, na dika utaku-ukwu aka-nri, nke gi ka ọ bu.

19 Àjà-nbuli nile nke ihe nsọ nile, nke umu Israel nēbuliri Jehova, ka M’nyeworo gi, nye kwa umu-gi ndikom, nye kwa umu-gi ndinyom, tiyere gi, n’ukpuru ebighi-ebi: ọb͕ub͕a-ndu nnú ebighi-ebi n’iru Jehova ka ọ buru gi, buru kwa nkpuru-gi tiyere gi.

20 Jehova we si Eron, I gaghi-eketa ihe n’ala-ha, ọ dighi kwa òkè i gēnwe n’etiti ha: Mu onwem bu òkè-gi na ihe-nketa-gi n’etti umu Israel.

21 Ma umu Livai, le, ha ka M’nyeworo otù uzọ n’uzọ iri nke ihe nile n’Israel, ibu ihe-nketa, dika ihe-nkwughachi òfùfè-ha, nke ha onwe-ha nēfè, bú òfùfè nke ulo-ikwū nzute.

22 Ma umu Israel agaghi-abiaru nso ulo-ikwū nzute ahu ọzọ ibū nmehie, inwu anwu.

23 Ma ndi Livai gēfè òfùfè ahu nke ulo-ikwū nzute, ha onwe-ha gēbu kwa ajọ omume-ha: ukpuru ebighi-ebi ka ọ bu rue ọb͕ọ nile unu, ma n’etiti umu Israel ha agaghi-eketa ihe-nketa.

24 N’ihi na ọ bu otù uzọ n’uzọ iri nke ihe umu Israel, nke ha nēbuliri Jehova dika àjà-nbuli, ka M’nyeworo ndi Livai, ibu ihe-nketa: ya mere M’siworo ha, N’etiti umu Israel ha agaghi-eketa ihe-nketa.

25 Jehova we gwa Moses okwu, si,

26 I gāgwa kwa ndi Livai okwu, si ha, Mb͕e unu nānara n’aka umu Israel otù uzọ n’uzọ iri nke M’nyeworo unu site n’aka-ha, dika ihe-nketa-unu, unu gēsi kwa na ya bulie àjà-nbuli nke Jehova, bú otù uzọ n’uzọ iri nke si n’otù uzọ n’uzọ iri ahu puta.

27 Agāgu-kwa-ra unu àjà-nbuli-unu, dika ọka nke si n’ebe-nzọcha-ọka puta, na dika ojuju-manya-vine nke si n’ebe-nzọcha-nkpuru-vine puta.

28 Otú a ka unu gēbuli, ọbuná unu onwe-unu, àjà-nbuli nke Jehova sitere n’otù uzọ n’uzọ iri nke ihe unu nile, nke unu nānara n’aka umu Israel; unu gēsi kwa na ya nye Eron, bú onye-nchu-àjà, àjà-nbuli nke Jehova.

29 Unu gēsi n’onyinye-unu nile bulie àjà-nbuli ọ bula nke Jehova, site n’ihe-ya nile kachasi nma, bú ihe nsọ ya sitere na ya.

30 I gāsi kwa ha, Mb͕e unu nēsi na ya bulie ihe-ya kachasi nma, agāgu-kwa-ra ndi Livai ya dika ihe-ọmume nke ebe-nzọcha-ọka, na dika ihe-ọmume nke ebe-nzọcha-nkpuru-vine.

31 Unu gēri kwa ya n’ebe ọ bula, unu onwe-unu na ulo nile unu: n’ihi na ugwọ-ọlu ka ọ buru unu, bú ihe-nkwughachi òfùfè-unu n’ulo-ikwū nzute.

32 Unu agaghēbu kwa nmehie bayere ya, mb͕e unu si na ya bulie ihe-ya kachasi nma: unu agaghi-emeru kwa ihe nsọ nile nke umu Israel, unu agaghi-anwu kwa.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 19

1 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,

2 Nka bu ukpuru nke iwu ahu nke Jehova nyeworo n’iwu, si, Gwa umu Israel okwu, ka ha wetara gi nwa-ab͕ọghọ-ehi nācha uhie uhie nke zuru okè, nke ọlu nādighi n.aru-ya, nke ọ dighi mb͕e yoke rigokwasiri ya:

3 unu gēnye ya Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ọ gēme ka ọ pua je n’azu ọmuma-ulo-ikwū, otù onye gēb͕u ya n’iru ya:

4 Eleeza, bú onye-nchu-àjà, gēwere ufọdu nime ọbara-ya na nkpisi-aka-ya, fesa ufọdu nime ọbara-ya na ncherita-iru ulo-ikwū nzute ub͕ò asa:

5 otù onye gēsure kwa nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu ọku n’anya-ya; akpukpọ-ya, na anu-ya, na ọbara-ya, tiyere nsi-ya, ka o gēsure ọku:

6 onye-nchu-àjà gēwere kwa osisi cedar, na hyssop, na ogho uhie, tubà ya n’etiti nsure-ọku nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu.

7 onye-nchu-àjà gāsu kwa uwe-ya, sa kwa anu-aru-ya na miri, emesia ọ gābata n’ọmuma-ulo-ikwū, onye-nchu-àjà gāru kwa árú rue anyasi.

8 Onye ahu nke nēsure ya ọku gāsu kwa uwe-ya na miri, sa kwa anu-aru-ya na miri, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

9 Nwoke nke di ọcha gāchikọta ntu nke nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu, do ya n’azu ọmuma-ulo-ikwū n’ebe di ọcha, ọ gābu-kwa-ra umu Israel ihe-ndebe ibu miri nke idi-na-nsọ: àjà-nmehie ka ọ bu.

10 Onye ahu nke nāchikọta ntu nwa-ab͕ọghọ-ehi gāsu kwa uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi: ọ gābu-kwa-ra umu Israel, buru kwa ọbìa nke nọ dika ọbìa n’etiti ha, ukpuru ebighi-ebi.

11 Onye nēmetu ozu nwuru anwu nke madu ọ bula aru gāru árú ubọchi asa:

12 onye ahu gēwere ya wepu nmehie-ya n’ubọchi nke-atọ, n’ubọchi nke-asa ọ gādi kwa ọcha: ma ọ buru na o wepughi nmehie-ya n’ubọchi nke-atọ, ọ gaghi-adi kwa ọcha n’ubọchi nke-asa.

13 Onye ọ bula nke nēmetu onye nwuru anwu aru, bú ozu madu nke nwuru anwu, ma o wepughi nmehie-ya, ebe obibi Jehova ka ọ nēmeru; agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n’Israel n’ihi na awusaghi ya miri nke idi-na-nsọ ahu, onye ruru árú ka ọ gābu; ọrurú-ya nādikwasi ya rue ub͕u a.

14 Nka bu iwu mb͕e madu nwuru n’ulo-ikwū: onye ọ bula nke nāba n.ulo-ikwū ahu, na onye ọ bula nke nọ n’ulo-ikwū ahu, gāru árú ubọchi asa.

15 Ihe ọ bula nke ghere oghe, nke nēnweghi ihe-nkpuchi eriri eji kechi elu-ya, ihe ruru árú ka ọ bu.

16 Onye ọ bula nke nēmetu onye eji mma-agha b͕u, ma-ọbu onye nwuru anwu, ma-ọbu ọkpukpu madu, ma-ọbu ílì, aru, n’ọhia sara iru, ọ gāru árú ubọchi asa.

17 Ha gēwere kwa ufọdu nime ntu nsure-ọku àjà-nmehie ahu bayere onye ahu ruru árú, agētiye kwa miri nērù erù n’elu ya nime ihe:

18 nwoke nke di ọcha gēwere kwa hyssop, sue ya na miri ahu, fesa ya n’ulo-ikwū ahu, na n’ihe-ya nile, na n’aru ndi nọ n’ebe ahu, na n’aru onye ahu nke metuworo ọkpukpu ahu, maọbu onye eb͕uru eb͕u ahu, ma-ọbu onye nwuru anwu ahu, maọbu ílì ahu, aru:

19 onye ahu nke di ọcha gēfesa kwa onye ahu ruru árú n’ubọchi nke-atọ, na n’ubọchi nke-asa: ọ gēwepu kwa nmehie-ya n’ubọchi nke-asa; ọ gāsu kwa uwe-ya, sa kwa aru-ya na miri, di ọcha n’anyasi.

20 Ma nwoke nke ruru árú, ma ọ dighi-ewepu nmehie-ya, agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n’etiti nkpọkọta Israel, n’ihi na ọ bu nsọ Jehova ka ọ meruworo: awusaghi ya miri nke idi-na-nsọ ahu, onye ruru árú ka o bu.

21 Ọ gābu-kwa-ra ha ukpuru ebighi-ebi; onye nēfesa miri nke idi-na-nsọ ahu gāsu kwa uwe-ya; onye nēmetu miri nke idi-na-nsọ ahu aru gāru kwa árú rue anyasi.

22 Ihe ọ bula onye ruru árú nēmetu aru gāru árú; madu nke nēmetu ya aru gāru árú rue anyasi.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 20

1 Umu Israel, bú nzukọ ahu nile, we ba n’ọzara Zin n’ọnwa mbu: ndi Israel we nọdu na Kedesh; Miriam we nwua n’ebe ahu, ewe lìe ya n’ebe ahu.

2 Ma ọ dighi miri nzukọ ahu nwere: ha we kpọkọta onwe-ha megide Moses, megide kwa Eron.

3 Ndi Israel we so Moses se okwu, ha we kwue, si, Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi ekubiwo mb͕e umu-nne-ayi kubiri n’iru Jehova!

4 Ọ̀ bu kwa n’ihi gini ka unu meworo nkpọkọta Jehova ka ọ ba n’ọzara nka, inwu n’ebe ahu, ayi onwe-ayi na anu-ulo-ayi?

5 Ọ̀ bu kwa n’ihi gini ka unu meworo ka ayi si n’Ijipt rigoputa, ime ayi ka ayi bata n’ebe ọjọ a? ọ bughi ebe nke nkpuru-ọghigha, ma-ọbu nke osisi fig, ma-ọbu nke osisi vine, ma-ọbu nke osisi pomegranate; ọ dighi kwa miri iṅu.

6 Moses na Eron we si n’iru nkpọkọta ahu biarute ọnu-uzọ ulo-Ikwū nzute, da kpue-iru-ha n’ala: ewe me ka ha hu ebube Jehova anya.

7 Jehova we gwa Moses okwu, si,

8 Were nkpa-n’aka ahu, kpọkọta kwa nzukọ Israel, gi onwe-gi, na Eron, bú nwa-nne-gi, unu gwa nkume ahu di elu okwu n’anya-ha, ka ọ we nye miri-ya; i gēme kwa ka miri si na nkume ahu di elu putara ha: i gēme kwa ka nzukọ ahu na anu-ulo-ha ṅua miri.

9 Moses we si n’iru Jehova were nkpa-n’aka ahu, dika O nyere ya iwu.

10 Moses na Eron we kpọkọta nkpọkọta Israel rue iru nkume ahu di elu, ọ si ha, Biko, nurunu, ndi nenupu isi, àyi gēme ka miri si na nkume a di elu putara unu?

11 Moses we welie aka-ya were nkpa-n’aka-ya tie nkume ahu di elu ub͕ò abua: miri riri nne we puta, nzukọ ahu we ṅua, ha na anu-ulo nile ha.

12 Jehova we si Moses na Eron, N’ihi na unu ekweghi na Mu, idom nsọ n’anya umu Israel, n’ihi ya unu agaghi-eme ka nkpọkọta nka ba n’ala ahu nke M’nyeworo ha.

13 Ndia bu miri Meriba; n’ihi na umu Israel soro Jehova se okwu, ewe do Ya nsọ nime ha.

14 Moses we si na Kedesh zigara eze Edom ndi-ozi, si, Otú a ka Israel, bú nwa-nne-gi, siri, Gi onwe-gi amawo ike-ọgwugwu nile nke gwuworo ayi:

15 na nna-ayi-hà ridara n’Ijipt, ayi we biri n’Ijipt ọtutu ubọchi; ndi Ijipt we mejo ayi, mejọ kwa nna-ayi-hà:

16 ayi we tikue Jehova, O we nu olu-ayi, zite mọ-ozi, me ka ayi si n’Ijipt puta: ma, le ayi onwe-ayi nọ na Kedesh, bú obodo nke di na nsọtu ókè-ala-gi:

17 biko, ka ayi gabiga nime ala-gi: ayi agaghi-agabiga nime ọhia ma-ọbu nime ubi-vine, ayi agaghi-aṅu kwa miri olùlù: n’uzọ eze ka ayi ganēje, ayi agaghi-ewezuga onwe-ayi n’aka-nri ma-ọbu n’aka-ekpe, rue mb͕e ayi gāgabiga ókè-ala-gi.

18 Edom we si ya, I gaghi-agabiga nimem, ka m’we ghara iwere mma-agha puta izute gi.

19 Umu Israel we si ya, Ọ bu n’uzọ atuliri atuli ka ayi gārigo: ọ buru kwa na ayi aṅua miri-gi, mu onwem na anu-ulom, m’gēnye kwa gi ọnu-ahia-ya: nání ka m’were ukwum gabiga, ọ dighi ọzọ.

20 O we si, I gaghi-agabiga. Edom we were ndi di uku aka di ike puta izute ya.

21 Edom we ju ikwe ka Israel gabiga n’ókè-ala-ya: Israel we si n’ebe ọ nọ wezuga onwe-ya.

22 Ha we si na Kedesh bulie ije: umu Israel, bú nzukọ ahu nile, we biarue ugwu Hoa.

23 Jehova we gwa Moses na Eron okwu n’ugwu Hoa, n’akuku ókè ala Edom si,

24 Agāchikọta Eron na umu-nna-ya n’ala-mọ’ n’ihi na ọ gaghi-abà n’ala ahu nke M’nyeworo umu Israel, n’ihi na unu nupuru isi n’okwu-ọnum na miri Meriba.

25 Chiri Eron na Eleeza nwa-ya, me ka ha rigota n’ugwu Hoa:

26 i gēyipu Eron uwe-ya, yibe ha Eleeza nwa-ya: agāchikọta Eron na umu-nna-ya n’ala-mọ, ọ gānwu kwa n’ebe ahu.

27 Moses we me dika Jehova nyere ya iwu: ha we rigo n’ugwu Hoa n’anya nzukọ Israel nile.

28 Moses we yipu Eron uwe-ya, yibe ha Eleeza nwa-ya; Eron we nwua n’ebe ahu n’elu ugwu ahu: Moses na Eleeza we si n’ugwu ahu ridata.

29 Nzukọ Israel nile we hu na Eron ekubiwo, ha we kwara Eron ákwá orú ubọchi na iri, bú ulo Israel nile.