Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 1

1 Jehova we gwa Moses okwu n’ọzara Sainai, n’ulo-ikwū nzute, n’ubọchi mbu nke ọnwa nke-abua, n’arọ nke-abua nke ọpupu ha puru n’Ijipt, si,

2 Gutanu ọnu-ọgugu nzukọ nile nke umu Israel, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n’ọnu-ọgugu aha nile, nwoke ọ bula, onye na isi-ya onye na isi-ya;

3 site n’onye b͕ara orú arọ we gaba n’iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha n’Israel, unu gāgukọta ha, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, gi onwe-gi na Eron.

4 Madu ganọye-kwa-ra unu, otù nwoke gādiri otù ebo; nwoke ọ bula, onye-isi ulo nna-ya-hà ka ọ bu.

5 Ndia bu kwa aha ndikom unu na ha gēguzo: nke Reuben; Elizua nwa Shedeua.

6 Nke Simeon; Shelumiel nwa Zurishadai.

7 Nke Juda, Nahshon nwa Aminadab.

8 Nke Isaka; Netanel nwa Zua.

9 Nke Zebulun; Eliab nwa Hilon.

10 Nke umu Josef: nke Efraim; Elishama nwa Amihud: nke Manase; Gameliel nwa Pedahzua.

11 Nke Benjamin; Abidan nwa Gideoni.

12 Nke Dan; Ahieza nwa Amishadai.

13 Nke Asha; Pagiel nwa Ọkran.

14 Nke Gad; Eliasaf nwa Deuel.

15 Nke Naftali; Ahira nwa Inan.

16 Ndia bu ndi akpọrọ nke nzukọ Israel, ndi-isi ebo nile nke ndi bu nna-ha; ndi-isi nke usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel ka ha bu.

17 Moses na Eron we chiri ndikom ndia nke akpọrọ n’aha n’aha:

18 ọ bu kwa nzukọ Israel nile ka ha kpọkọtara n’ubọchi mbu nke ọnwa nke-abua, ha we kọ akukọ osuso-ọmumu-ha dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n’ọnu-ọgugu aha, site n’onye b͕ara orú arọ we gaba n’iru, onye na isi-ya onye na isi-ya.

19 Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka ọ gukọtara ha n’ọzara Sainai.

20 Ma umu Reuben, bú ọkpara Israel, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n’ọnu-ọgugu aha, onye na isi-ya onye na isi-ya, nwoke ọ bula site n’onye b͕ara orú arọ we gaba n’iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

21 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Reuben, ha di orú nnù uzọ ise na nnù iri-na-isi na ọgu ise.

22 Nke umu Simeon, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ndi-ha agukọtara agukọta, n’ọnu-ọgugu aha, onye na isi-ya onye na isi-ya, nwoke ọ bula site n’onye b͕ara orú arọ we gaba n’iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

23 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Simeon, ha di orú nnù uzọ asa na nnù asatọ na ọgu ise.

24 Nke umu Gad, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n’ọnu-ọgugu aha, site n’onye b͕ara orú arọ we gaba n’iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

25 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Gad, ha di orú nnù uzọ ise na nnù iri-na-anọ na ọgu abua na iri.

26 Nke umu Juda, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n’onu-ọgugu aha, site n’onye b͕ara oru arọ we gaba n’iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

27 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Juda, ha di orú nnù uzọ iteghete na nnù isi na ọgu iri.

28 Nke umu Isaka, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n’ọnu-ọgugu aha, site n’onye b͕ara orú arọ we gaba n’iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

29 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Isaka, ha di orú nnù uzọ isi na nnù iri-na-isi.

30 Nke umu Zebulun, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n’ọnu-ọgugu aha, site n’onye b͕ara orú arọ we gaba n’iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

31 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Zebulun, ha di orú nnù uzọ asa na nnù atọ na ọgu iri.

32 Nke umu Josef, bú nke umu Efraim, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n’ọnu-ọgugu aha, site n’onye b͕ara orú arọ we gaba n’iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

33 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Efraim, ha di orú nnù uzọ ise na nnu na ọgu ise.

34 Nke umu Manase, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n’ọnu-ọgugu aha, site n’onye b͕ara orú arọ we gaba n’iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

35 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Manase, ha di orú nnù uzọ anọ na ọgu iri.

36 Nke umu Benjamin, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n’ọnu-ọgugu aha, site n’onye b͕ara orú arọ we gaba n’iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

37 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Benjamin, ha di orú nnù uzọ anọ na nnù asatọ na ọgu iri.

38 Nke umu Dan, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n’ọnu-ogugu aha, site n’onye b͕ara orú arọ we gaba n’iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

39 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Dan, ha di orú nnù uzọ asa na nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-ise.

40 Nke umu Asha, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n’ọnu-ọgugu aha, site n’onye b͕ara orú arọ we gaba n’iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

41 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Asha, ha di orú nnù uzọ ise na nnù atọ na ọgu iri-na-ise.

42 Nke umu Naftali, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n’ọnuọgugu aha, site n’onye b͕ara orú arọ we gaba n’iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

43 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Naftali, ha di orú nnù uzọ isi na nnù iri-na-atọ na ọgu iri.

44 Ndia bu ndi agukọtara agukọta, ndi Moses na Eron gukọtara, ha na ndi-isi Israel, bú ndikom iri na abua: otù nwoke otù nwoke diri ulo nna-ya-hà ka ha bu.

45 Ndi nile nke umu Israel agukọtara agukọta we di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, site n’onye b͕ara orú arọ we gaba n’iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha n’Israel;

46 ọbuná ndi nile agukọtara agukọta we di orú nnù ọgu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù asatọ, na ọgu iri-na-asa, na iri.

47 Ma ndi Livai, dika ebo nke ndi bu nna-ha si di, agukọtaghi ha n’etiti ha.

48 N’ihi na Jehova gwara Moses okwu, si,

49 Nání, agukọtala ebo Livai, aguta-kwa-la ọnu-ọgugu-ha n’etiti umu Israel:

50 ma gi onwe-gi me ndi Livai ka ha buru ndi nēlekọta ebe-obibi ihe-àmà, ndi nēlekọta kwa lhe-ya nile, ndi nēlekọta kwa ihe nile diri ya: ha onwe-ha ganēbu ebe-obibi ahu, na ihe-ya nile: ha onwe-ha gēje-kwa-ra ya ozi, ọ bu kwa buruburu ebe-obibi ahu ka ha gāma ulo-ikwū-ha.

51 Ma na nbuli-ije nke ebe-obibi ahu, ndi Livai gēweda ya: ọzọ, n’ọmuma nke ebe-obibi ahu, ndi Livai gēguzo ya ọtọ: ma onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.

52 Umu Israel gāma kwa ulo-ikwū-ha, nwoke ọ bula n’akuku ọmuma-ulo-ikwū-ya, na nwoke ọ bula n’akuku ọkọlọtọ-ya, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di.

53 Ma ndi Livai gāma ulo-ikwū-ha buruburu ebe-obibi ihe-àmà ahu, ka iwe we ghara idi n’aru nzukọ umu Israel: ndi Livai gēdebe kwa ihe-ndebe nke ebe-obibi ihe-àmà ahu.

54 Umu Israel we me otú a; dika ihe nile nke Jehova nyere Moses n’iwu si di, otú a ka ha mere.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 2

1 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,

2 Umu Israel gāma ulo-ikwū-ha, nwoke ọ bula n’akuku ọkọlọtọ-ya, ha na ihe-iriba-ama nile nke diri ulo nke ndi bu nna-ha: na ncherita-iru ulo-ikwū nzute ka ha gāma ulo-ikwū-ha buruburu.

3 Ndi nāma ulo-ikwū-ha n’akuku. Iru-anyanwu chere iru n’ọwuwa-anyanwu bu ndi nke ọkọlọtọ ọmuma-ulo-i kwū Juda, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: onye-isi umu Juda nwere bu Nahshon nwa Aminadab.

4 Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ iteghete na nnù isi na ọgu iri.

5 Ndi nāma ulo-ikwū-ha n’akuku-ya bu ebo Isaka: onye-isi umu Isaka nwere bu Netanel nwa Zua:

6 usu-ndi-agha-ya, na ndi-ya agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ isi na nnù iri-na-isi:

7 ebo Zebulun kwa: onye-isi umu Zebulun nwere bu Eliab nwa Hilon:

8 usu-ndi-agha-ya, na ndi-ya agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ asa na nnù atọ na ọgu iri.

9 Ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū Juda di orú nnù orú uzọ na uzọ atọ, na nnù isi, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di. Ha gēbu uzọ buli ije.

10 Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Reuben di n’akuku Ndida, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di; onye-isi umu Reuben nwere bu Elizua nwa Shedeua.

11 Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ya agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ ise na nnù iri-na-isi na ọgu ise.

12 Ndi nāma ulo-ikwū-ha n’akuku-ya bu ebo Simeon: onye-isi umu Simeon nwere bu Shelumiel nwa Zurishadai:

13 usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ asa na nnù asatọ na ọgu ise:

14 ebo Gad kwa: onye-isi umu Gad nwere bu Eliasaf nwa Reuel:

15 usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ ise na nnù iri-na-anọ na ọgu abua na iri.

16 Ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū Reuben di orú nnù uzọ iri na asatọ, na nnù iri-na-asatọ, na ọgu iri-na-abua, na iri, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di. Ha gābu nke-abua n’ibuli ije.

17 Ulo-ikwū nzute gēbuli kwa ije, ya na ọmuma-ulo-ikwū ndi Livai, n’etiti ọmuma-ulo-ikwū nile: dika ha si ama ulo-ikwū-ha, otú a ka ha gēbuli ije, nwoke ọ bula n’akuku-ya, dika ọkọlọtọ nile ha si di.

18 Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Efraim, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, di n’akuku Ọdida-anyanwu: onye-isi umu Efraim nwere bu Elishama nwa Amihud.

19 Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ ise na nnù na ọgu ise.

20 N’akuku-ya ka ebo Manase di: onye-isi umu Manase nwere bu Gameliel nwa Pedahzua:

21 Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ anọ, na ọgu iri:

22 ebo Benjamin kwa: onye-isi umu Benjamin nwere bu Abidan nwa Gideoni:

23 Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ anọ na nnù asatọ na ọgu iri.

24 Ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū Efraim di orú nnù uzọ iri-na-atọ, na nnù iri, na ọgu ise, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di. Ha gābu nke-atọ n’ibuli ije.

25 Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Dan di n’akuku Ugwu, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di; onye-isi umu Dan nwere bu Ahieza nwa Amishadai.

26 Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ asa na nnù iri-na-isi na ọgu iri-na ise.

27 Ndi nāma ulo-ikwū-ha n’akuku-ya bu ebo Asha: onye-isi umu Asha nwere bu Pagiel nwa Ọkran:

28 usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ ise na nnù atọ na ọgu iri-na-ise:

29 ebo Naftali kwa: onye-isi umu Naftali nwere bu Ahira nwa Inan:

30 usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ isi na nnù iri-na-atọ na ọgu iri.

31 Ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū Dan di orú nnù uzọ iri-na-iteghete, na nnù iri-na-anọ. Ha gābu ndi ikpe azu n’ibuli ije, dika ọkọlọtọ nile ha si di.

32 Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke umu Israel, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di: ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū nile, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, di orú nnù ọgu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù asatọ, na ọgu iri-na-asa, na iri.

33 Ma agukọtaghi ndi Livai n’etiti umu Israel; dika Jehova nyere Moses iwu

34 Umu Israel we me otú a; dika ihe nile Jehova nyere Moses n’iwu si di, otú a ka ha mara ulo-ikwū-ha dika ọkọlọtọ nile ha si di, ọ bu kwa otú a ka ha buliri ije, nwoke ọ bula dika ab͕uru nile ya si di, n’ulo nna-ya-hà

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 3

1 Ma ndia bu osuso-ọmumu nile nke Eron na Moses n’ubọchi Jehova gwara Moses okwu n’ugwu Sainai.

2 Ndia bu kwa aha umu-ndikom Eron;ọkpara-ya, bú Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.

3 Ndia bu aha nke umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà ndi etere manu, ndi ọ mejuru aka ibu ndi-nchu-àjà.

4 Nedab na Abaihu we nwua n’iru Jehova, mb͕e ha wetara nso ọku ala ọzọ n’iru Jehova n’ọzara Sainai, ha enweghi kwa nwa; Eleeza na Itama we buru ndi-nchu-àjà n’iru Eron, bú nna-ha.

5 Jehova we gwa Moses okwu, si,

6 Me ka ebo Livai biaru nso, guzo kwa ha n’iru Eron, bú onye-nchu-àjà, ka ha we jere ya ozi.

7 Ha gēdebe kwa ihe-ndebe-ya na ihe-ndebe nke nzukọ Israel nile n’iru ulo-ikwū nzute, ifè òfùfè nke ebe-obibim.

8 Ha gēdebe kwa ihe nile nke ulo-ikwū nzute, na ihe-ndebe nke umu Israel, ifè òfùfè nke ebe-obibim.

9 I gēwere kwa ndi Livai nye Eron, nye kwa umu-ya ndikom: ndi enyesiworo aha ha nile site n’etiti umu Israel ka ha bu.

10 I gēwere kwa Eron na umu-ya ndikom ka ha buru ndi-nlekọta, ha gēdebe kwa ọlu-nchu-àjà-ha: ma onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.

11 Jehova we gwa Moses okwu, si,

12 Ma Mu onwem, le, esiwom n’etiti umu Israel were ndi Livai n’ọnọdu nwa ọ bula eburu uzọ mu nke nēmeghe àkpà nwa n’etiti umu Israel; ndi Livai gābu kwa ihe M’nwere:

13 n’ihi na Mu nwe nwa ọ bula eburu uzọ mu; n’ubọchi M’tib͕uru umu nile eburu uzọ mu n’ala Ijipt ka M’doro umu nile eburu uzọ mu n’Israel nsọ nye onwem, ma madu ma anumanu: nkem ka ha bu; Mu onwem bu Jehova.

14 Jehova we gwa Moses okwu n’ọzara Sainai, si,

15 Gukọta umu Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, dika ab͕uru nile ha si di; nwoke ọ bula site n’onye ruru otù ọnwa we gaba n’iru ka i gāgukọta ha.

16 Moses we gukọta ha n’okwu-ọnu Jehova, dika enyere ya iwu.

17 Ndia bu kwa umu-ndikom Livai n’aha-ha; Giashon, na Kohat, na Merari.

18 Ndia bu kwa aha umu-ndikom Giashon dika ab͕uru nile ha si di; Libni na Shimai.

19 Umu-ndikom Kohat kwa dika ab͕uru nile ha si di; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel.

20 Umu-ndikom Merari kwa dika ab͕uru nile ha si di; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru ndi Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.

21 Nke Giashon bu ab͕uru ndi Libni, na ab͕uru ndi Shimai: ndia bu ab͕uru ndi Giashon.

22 Ndi-ha agukọtara agukọta, n’ọnu-ọgugu ndikom nile, site n’onye ruru otù ọnwa we gaba n’iru, ndi-ha águkotara agukọta di nnù iri-na-asatọ na ọgu iri-na-ise.

23 Ab͕uru abua nke ndi Giashon nāma ulo-ikwū-ha n’azu ebe-obibi ahu chere iru n’Ọdida-anyanwu.

24 Onye-isi ulo nna ndi Giashon nwere bu Eliasaf nwa Lael.

25 Ihe-ndebe nke umu-ndikom Giashon n’ulo-ikwū nzute bu ebe-obibi na Ulo-ikwū, na ihe-nkpuchi-ya, na ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute,

26 na ákwà-ngechi nile nke ogige ahu, na ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ ogige, nke di n’akuku ebe-obibi, na n’akuku ebe-ichu-àjà buruburu, na udọ̀-ya nile bayere òfùfè-ya nile.

27 Nke Kohat bu ab͕uru ndi Amram, na ab͕uru ndi Izha, na Ab͕uru ndi Hebron, na aburu ndi Uziel: ndia bu ab͕uru ndi Kohat.

28 N’ọnu-ọgugu ndikom nile, site n’onye ruru otù ọnwa we gaba n’iru, ha di orú nnù na otù nnù ọgu iri, nēdebe ihe-ndebe nke ebe nsọ ahu.

29 Ab͕uru nile nke umu Kohat nāma ulo-ikwū-ha n’isi ebe-obibi ahu chere iru na Ndida.

30 Onye-isi ulo nna ab͕uru ndi Kohat nwere bu Elizafan nwa Uziel.

31 Ihe-ndebe-ha bu ib͕e ahu, na table ahu, na ihe-idọba-oriọna, na ebe-ichu-àjà abua, na ihe nile nke ebe nsọ ahu nke ha ji je ozi na ákwà-nkwuchi ahu, na òfùfè-ya nile.

32 Onye-isi nke ndi-isi nke ndi Livai bu Eleeza nwa Eron onye-nchu-àjà, ọ nwere nlekọta ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe nsọ ahu.

33 Nke Merari bu ab͕uru ndi Mahli, na ab͕uru ndi Mushi: ndia bu ab͕uru Merari.

34 Ndi-ha agukọtara agukọta, n’ọnu-ọgugu ndikom nile, site n’onye ruru otù ọnwa we gaba n’iru, di nnù iri-na-ise na ọgu iri.

35 Onye-isi ulo nna nke ab͕uru abua Merari nwere bu Zuriel nwa Abihail: ha nāma ulo-ikwū-ha n’isi ebe-obibi ahu chere iru n’Ugwu.

36 Nlekọta nke ihe-ndebe nke umu Merari bu ibo nile nke ebe-obibi ahu, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na akwa ya nile, na ihe-ya nile, na òfùfè-ya nile:

37 na ide nile nke ogige ahu buruburu, na ukwu nile ha, na ǹtú nile ha, na udọ̀ nile ha.

38 Ndi nāma ulo-ikwū-ha n’iru ebe obibi ahu chere iru n’Iru-anyanwu, n’iru ulo-ikwū nzute chere iru n’ọwuwa-anyanwu, bu Moses, na Eron na umu-ya ndikom, nēdebe ihe-ndebe nke ebe nsọ ahu, bú ihe-ndebe nke umu Israel; onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.

39 Ndi nile agukọtara agukọta nke ndi Livai, ndi Moses na Eron gukọtara n’okwu-ọnu Jehova, dika ab͕uru nile ha si di, ndikom nile, site n’onye ruru otù ọnwa we gaba n’iru, di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na ise.

40 Jehova we si Moses, Gukọta umu-ndikom nile eburu uzọ muru umu Israel, site n’onye ruru otù ọnwa we gaba n’iru, guta kwa ọnu-ọgugu aha-ha.

41 I gēwe-kwa-ram ndi Livai (Mu onwem bu Jehova) n’ọnọdu umu nile eburu uzọ mu n’etiti umu Israel; na anu-ulo ndi Livai n’ọnọdu umu nile eburu uzọ mu n’etiti anu-ulo umu Israel.

42 Moses we gukọta umu nile eburu uzọ mu n’etiti umu Israel, dika Jehova nyere ya iwu.

43 Ndikom nile eburu uzọ mu, n’onu-ọgugu aha, site n’onye ruru otù ọnwa we gaba n’iru, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na-ise na ọgu iri-na-atọ na iri na atọ.

44 Jehova we gwa Moses okwu, si,

45 Were ndi Livai n’ọnọdu umu nile eburu uzọ mu n’etiti umu Israel, were kwa anu-ulo ndi Livai n’ọnọdu anu-ulo-ha: ndi Livai gābu kwa ihe M’nwere; Mu onwem bu Jehova

46 Ma ndi anāb͕aputa, bú ọgu madu iri-na-atọ na madu iri na atọ ahu sitere na ndi eburu uzọ mu nke umu Israel, ndi eji ka ndi Livai n’ọnu-ọgugu,

47 n’aka-ha ka i gānara shekel ise shekel ise n’isi n’isi; dika shekel nke ebe nsọ ahu si di ka i gēwere ha (shekel bu orú gerah):

48 i gēnye kwa Eron, nye kwa umu-ya ndikom, ego ahu ewere b͕aputa ndi ahu eji ka ndi Livai n’ọnu-ọgugu

49 Moses we nara ego nb͕aputa ahu n’aka ndi fọduru n’ọnu-ọgugu ndi ahu ndi Livai b͕aputara:

50 n’aka umu eburu uzọ mu nke umu Israel ka ọ nara ego ahu; nnù shekel atọ na ọgu asatọ na ise, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di;

51 Moses we nye Eron, nye kwa umu-ya ndikom, ego ndi ab͕aputara, n’okwu-ọnu Jehova, dika Jehova nyere Moses iwu.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 4

1 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,

2 Guta ọnu-ọgugu umu Kohat site n’etiti umu Livai, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di,

3 site n’onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n’iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ije ozi n’ulo-ikwū nzute.

4 Nka bu òfùfè umu Kohat n’ulo-ikwū nzute, bú ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile:

5 na nbuli-ije nke ọmuma-ulo-ikwū Eron gābà kwa nime, ya na umu-ya ndikom, ha gākwuda ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi ahu, were ya kpuchie ib͕e ihe-àmà ahu,

6 tiye kwa ihe-nkpuchi akpukpọ seal n’elu ya, b͕akwasi kwa ákwà anunu anunu n’elu, tiye kwa nkpa-n’aka-ya abua nime

7 N’elu table nke irum ka ha gāb͕akwasi ákwà anunu, tiye kwa n’elu ya afere-ya nile, na ngaji-ya nile, na ọkwa-ya nile, na iko nile nke nwusi àjà-ihe-ọṅuṅu: achicha anētiye mb͕e dum gādi kwa n’elu ya:

8 ha gāb͕akwasi kwa n’elu ha ákwà uhie, were kwa ihe-nkpuchi akpukpọ seal kpuchie ya, ha gētiye kwa nkpa-n’aka-ya abua nime.

9 Ha gēwere kwa ákwà anunu, kpuchie ihe-idọba-oriọna nke ihe ahu nēnye ìhè, na oriọna-ya nile, na nkpa-ya nile, na ihe-ikpakepu-ọku-ya nile, na ihe-manu-ya nile, nke ha were jere ya ozi:

10 ha gētiye kwa ya na ihe-ya nile nime ihe-nkpuchi akpukpọ seal, tukwasi ya n’ihe eji bū ya

11 Ọ bu kwa n’elu ebe-ichu-àjà ọla-edo ahu ka ha gāb͕akwasi ákwà anunu, were kwa ihe-nkpuchi akpukpọ seal kpuchie ya, tiye kwa nkpa-n’aka-ya abua nime:

12 ha gēwere kwa ihe nile nke ije-ozi ahu, nke ha ji je ozi n’ebe nsọ ahu, tiye ha nime ákwà anunu, were kwa ihe-nkpuchi akpukpọ seal kpuchie ha, tukwasi ha n’ihe eji bū ha.

13 Ha gēkpopu kwa ntu n’ebe-ichu-àjà, b͕akwasi n’elu ya ákwa ododo:

14 ha gētiye kwa n’elu ya ihe nile ya, nke ha ji je ozi n’akuku ya, bú ihe-igu-ọku-ya nile, na ndudu-ya nile, na osekè-ya nile, na ọkwa-nwusa-ya, ihe nile nke ebe-ichu-àjà ahu; ha gāb͕akwasi kwa n’elu ya ihe-nkpuchi akpukpọ seal, tinye kwa nkpa-n’aka-ya abua nime.

15 Ma mb͕e Eron na umu-ya ndikom kpuchisiri ebe nsọ ahu, na ihe nile nke ebe nsọ ahu, nime nbuli-ije nke ọmuma-ulo-ikwū; emesia, umu Kohat gābia ibū ya: ma ha agaghi-emetu ebe nsọ ahu aka, ha we ghara inwu. Ihe ndia bu ibu umu Kohat n’ulo-ikwū nzute.

16 Ihe-nlekọta Eleeza nwa Eron onye-nchu-àjà bu manu nke ihe nēnye ìhè, na ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na onyinye-inata-iru-ọma anēnye mb͕e dum, na manu nke otite-manu ahu, ihe-nlekọta nke ebe-obibi ahu nile, na nke ihe nile di nime ya, bú nime ebe nsọ ahu na nime ihe-ya nile.

17 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,

18 Unu ebipula ebo nke ab͕uru nile nke ndi Kohat n’etiti ndi Livai:

19 ma menu ha nka, ka ha we di ndu, ghara inwu, mb͕e ha nābiaru ebe nsọ ahu kachasi ebe nsọ nile nso: Eron na umu-ya ndikom gābata, do ha, nwoke ọ bula n’òfùfè-ya na n’ibu- ya:

20 ma ha agaghi-abata ihu ebe nsọ ahu ọbuná na obere oge, ka ha ghara inwu.

21 Jehova we gwa Moses okwu, si,

22 Guta kwa ọnu-ọgugu umu Giashon. ha onwe-ha, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, dika ab͕uru nile ha si di;

23 site n’onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n’iru rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri ka i gāgukọta ha; onye ọ bula nke nābà ibu agha, ifè òfùfè n’ulo-ikwū nzute.

24 Nka bu òfùfè nke ab͕uru nile nke ndi Giashon, ifè òfùfè na ibū ibu:

25 ha gēbu kwa ákwà-nkwuba nile nke ebe-obibim, na ulo-ikwū nzute, ihe-nkpuchi-ya, na ihe-nkpuchi akpukpọ seal nke dikwasiri ya n’elu, na ákwà-nkwuchi di n’ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute;

26 na ákwà-ngechi nile nke ogige ahu, na ákwà-nkwuchi di n’onu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke ogige ahu, nke di n’akuku ebe-obibi ahu na n’akuku ebe-ichu-àjà buruburu, na udọ̀ nile ha, na ihe nile nke òfùfè-ha, na ihe ọ bula agēmere ha, ha gēfè kwa òfùfè nime ya.

27 N’okwu-ọnu Eron na umu-ya ndikom ka òfùfè nile nke umu ndi Giashon gādi, n’ibu-ha nile, na n’òfùfè-ha nile: unu gēme kwa ka ha nēlekọta ibu-ha nile n’ihe-ndebe-ha.

28 Nka bu òfùfè nke ab͕uru nile nke umu ndi Giashon n’ulo-ikwū nzute: ihe-ndebe-ha gādi n’aka Itama nwa Eron, bú onye-nchu-àjà.

29 Umu Merari, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ka i gāgukọta kwa ha;

30 site n’onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n’iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri ka i gāgukọta ha, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ifè òfùfè nke ulo-ikwū nzute.

31 Nka bu kwa ihe-ndebe nke ibu-ha, dika òfùfè-ha nile si di n’ulo-ikwū nzute; ibo nile nke ebe-obibim, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na ukwu-ya nile;

32 na ide nile nke ogige ahu buruburu, na ukwu nile ha, na ǹtú nile ha, na udọ̀ nile ha, tiyere ihe-ha nile, tiyere kwa òfùfè-ha nile: n’aha n’aha ka unu gāgukọta ihe nke ihe-ndebe nke ibu-ha.

33 Nka bu òfùfè nke ab͕uru nile nke umu Merari, dika òfùfè-ha nile si di, n’ulo-ikwū nzute, n’aka Itama nwa Eron, bú onye-nchu-àjà.

34 Moses na Eron na ndi-isi nzukọ Israel we gukọta umu ndi Kohat dika ab͕uru nile ha si di, na dika ulo nke ndi bu nna-ha si di,

35 site n’onye b͕ara orú arọ na iri gaba n’iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ifè òfùfè n’ulo-ikwū nzute:

36 ndi-ha agukọtara agukọta, dika ab͕uru nile ha si di, di nnù isi na ọgu iri-na-asa na iri.

37 Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke ab͕uru nile nke ndi Kohat, onye ọ bula nke nēfè òfùfè n’ulo-ikwū nzute, ndi Moses na Eron gukọtara n’okwu-ọnu Jehova n’aka Moses.

38 Ndi agukọtara agukọta nke umu Giashon, dika ab͕uru nile ha si di, na dika ulo nke ndi bu nna-ha si di,

39 site n’onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n’iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ifè òfùfè n’ulo-ikwū nzute,

40 ọbuná ndi-ha agukọtara agukọta, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, di nnù isi na ọgu iri-na-otù na iri.

41 Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke ab͕uru nile nke umu Giashon, onye ọ bula nke n-efè òfùfè n’ulo-ikwū nzute, ndi Moses na Eron gukọtara n’okwu-ọnu Jehova.

42 Ndi agukọtara agukọta nke ab͕uru nile nke umu Merari, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di,

43 site n’onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n’iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ifè òfùfè n’ulo-ikwū nzute,

44 ọbuná ndi-ha agukọtara agukọta, dika ab͕uru nile ha si di, di nnù asatọ.

45 Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke ab͕uru nile umu Merari, ndi Moses na Eron gukọtara n’okwu-ọnu Jehova n’aka Moses.

46 Ndi nile agukọtara agukọta nke ndi Livai, ndi Moses na Eron na ndi-isi Israel gukọtara, dika ab͕uru nile ha si di, na dika ulo nke ndi bu nna-ha si di,

47 site n’onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n’iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābà ifè òfùfè, na òfùfè nke ibu n’ulo-ikwū nzute,

48 ọbuná ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù na otù nnù na ọgu iteghete.

49 N’okwu-ọnu Jehova ka agukọtara ha n’aka Moses, nwoke ọ bula dika ibu-ya si di: bú ndi-ya agukọtara agukọta, dika Jehova nyere Moses iwu.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 5

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Nye umu Israel iwu, ka ha chupu n’ọmuma-ulo-ikwū onye-ekpenta ọ bula na onye ọ bula nwere orùrù, na onye ọ bula ruru árú site na madu nwuru anwu:

3 ma nwoke ma nwayi, unu gāchupu ha, n’azu ọmuma-ulo-ikwū ka unu gāchupu ha je; ka ha we ghara imeru ọmuma-ulo-ikwū-ha, nke Mu onwem bi n’etiti ha.

4 Umu Israel we me otú a, chupu ha je n’azu ọmuma-ulo-ikwū: dika Jehova gwara Moses okwu, otú a ka umu Israel mere.

5 Jehova we gwa Moses okwu, si,

6 Gwa umu Israel okwu, si, Nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ha gēme ihe nime nmehie nile nke madu, imekpu ihe-nmekpu megide Jehova, ikpe ewe ma nkpuru-obi ahu;

7 ha gēkwuputa kwa nmehie-ha nke ha meworo: ọ gēnyeghachi kwa ihe ikpe mara ya nime ya n’isi-ya, ọ bu kwa otù uzọ n’uzọ ise ya ka ọ gātukwasi ya, nye onye ahu ikpe mara ya bayere ya.

8 Ma ọ buru na nwoke ahu enweghi onye-nb͕aputa nke ọ gēnyeghachi ihe ahu nke ikpe mara ya nime ya, ihe ahu ikpe mara ya nime ya nke anēnyeghachi Jehova, onye-nchu-àjà gēnwe ya; nāgughi ebulu nke nkpuchi-nmehie, nke agēji kpuchiri ya nmehie-ya.

9 Ajà-nbuli ọ bula nke ihe nsọ nile nke umu Israel, nke ha nēweta nso onye-nchu-àjà, ọ bu ya gēnwe ya.

10 Ihe nsọ nile nke nwoke ọ bula, o bu ya gēnwe ha; ihe nwoke ọ bula gēnye onye-nchu-àjà, ọ bu ya gēnwe ya.

11 Jehova we gwa Moses okwu, si

12 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e nwunye nwoke ọ bula gējehie, we mekpue ihe-nmekpu megide ya,

13 ya na nwoke ọzọ ewe dina ka ọ ra aru n’aru-ya, ewe zopu ihe ahu n’anya di-ya kpuchi kwa ya, nwayi ahu ewe rua árú, ma ọ dighi onye-àmà megide ya, ejideghi kwa nwayi ahu;

14 mọ ekworo ewe garue nwoke ahu aru, o we kwo nwunye-ya ekworo, nwayi ahu ewe rua áru: ma-ọbu mb͕e mọ ekworo gāgarue ya arú, o we kwo nwunye-ya ekworo, ma nwayi ahu arughi árú:

15 nwoke ahu gēme kwa ka nwunye-ya biakute onye-nchu-àjà, ọ gēweta kwa n’ihi nwunye-ya onyinye-ya iji biaru nso, bú otù uzọ n’uzọ iri nke ephah utu ọka barley; ọ gaghi-awukwasi ya manu, ọ gaghi-atukwasa ya frankincense; n’ihi na onyinye-inata-iru-ọma nke ekworo ka ọ bu, bú onyinye-inata-iruọma nke ihe-ncheta, nēme ka echeta ajọ omume.

16 Onye-nchu-àjà gēme kwa ka ọ biarue nso, guzo ya n’iru Jehova:

17 onye-nchu-àjà gēwere kwa miri nsọ n’iko ájá: ọ bu kwa ufọdu nime ájá nke di n’ala-ulo ebe-obibim ka onye-nchu-àjà gēwere, tiye ya nime miri ahu:

18 onye-nchu-àjà gēguzo kwa nwayi ahu n’iru Jehova, tọpu agiri-isi nwayi ahu, tiye onyinye-inata-iru-ọma nke ihe-ncheta n’ọbu-aka-ya abua, onyinye-inata-iru-ọma nke ekworo ka ọ bu: ma n’aka onye-nchu-àjà ka miri ilu ahu gādi nke nēweta ọbubu-ọnu:

19 onye-nchu-àjà gēme kwa ka ọ ṅua iyi, ọ gāsi nwayi ahu, Ọ buru na gi na nwoke edinaghi, ọ buru kwa na i jehieghi ime ihe ruru árú, mb͕e i nọ n’okpuru di-gi, gi pua na miri ilu a nke nēweta ọbubu-ọnu:

20 ma asi na gi onwe-gi ejehiewo, mb͕e i nọ n’okpuru di-gi, asi kwa na i rua árú, nwoke nābughi di-gi ewe ra aru n’aru-gi:

21 onye-nchu-àjà gēwere kwa iyi nke ọb͕ub͕a-iyi ahu me ka nwayi ahu ṅua iyi, onye-nchu-àjà gāsi nwayi ahu, Jehova gēme gi ka i buru ihe-ọb͕ub͕a-iyi ka i buru kwa ihe-oṅuṅu-iyi n’etiti ndi-gi, mb͕e Jehova nēme ka apata-ukwu-gi bua aru, me kwa ka afọ-gi za aza;

22 miri a nke nēweta ọbubu-ọnu gābà kwa na ngiri-afọ-gi, ime ka afọ-gi za aza, na ime ka apata-ukwu-gi bua aru: nwayi ahu gāsi kwa, Amen, Amen.

23 Onye-nchu-àjà gēde kwa ọb͕ub͕a-iyi ndia n’akwukwọ, o gēhichapu kwa ha nime miri ilu ahu:

24 ọ gēme kwa ka nwayi ahu ṅua miri ilu nke nēweta ọbubu-ọnu: miri ahu nke nēweta ọbubu-ọnu gābà kwa nime ya ighọ ihe-ilu.

25 Onye-nchu-àjà gānara kwa onyinye-inata-iru-ọma nke ekworo n’aka nwayi ahu, fé onyinye-inata-iru-ọma ahu n’iru Jehova, weta ya nso ebe-ichu-àjà:

26 onye-nchu-àjà gēsi kwa n’onyinye-inata-iru-ọma ahu weju nweju-aka-ya, ka ọ buru ihe-ncheta-ya, o gēsure kwa ya ọku ibu ihe nēsì ísì utọ n’ebe-ichu-àjà, emesia ọ gēme ka nwayi ahu ṅua miri ahu.

27 Ma mb͕e ọ meworo ka ọ ṅua miri ahu, ọ gēru kwa ọ buru na ọ rua árú, mekpu ihe-nmekpu megide di-ya, na miri ahu nke nēweta ọbubu-ọnu gābà nime ya ighọ ihe-ilu, afọ-ya gāza kwa, apata-ukwu-ya gābu kwa aru: nwayi ahu gābu kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi n’etiti ndi-ya.

28 Ma ọ buru na nwayi ahu arughi árú, ma onye di ọcha ka ọ bu; ọ gāpu kwa ya, we turu ime.

29 Nka bu iwu ekworo, mb͕e nwayi nējehie, mb͕e ọ nọ n’okpuru di-ya, ọ we rua árú;

30 ma-ọbu mb͕e mọ ekworo gāgaru nwoke n’aru, ọ we kwo nwunye-ya ekworo; o gēguzo kwa nwayi ahu n’iru Jehova, onye-nchu-àjà gēme kwa ya iwu a nile.

31 Nwoke ahu gāpu kwa n’ajọ omume, ma nwayi gēbu ajọ omume-ya.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 6

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Gwa umu Israel okwu, si ha, Nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ọ gālu oké ọlu n’ikwe nkwa onye-Nazirait, ikewaputara Jehova onwe-ya:

3 na manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n’anya ka ọ gēkewaputa onwe-ya; ọ gaghi-aṅu manya-vine b͕ara uka, ma-ọbu ihe- ọṅuṅu nābà n’anya b͕ara uka, ọ gaghi-aṅu kwa miri nkpuru-vine ọ bula, ọ gaghi-eri kwa nkpuru-vine ọhu ma-ọbu nke amikọrọ amikọ.

4 Ubọchi nile nke nkewaputa-ya ọ dighi ihe nime ihe ọ bula emere site n’osisi vine nke manya-vine o gēri, site na nkpuru-ime-ya we rue mb͕ub͕ọ-ya.

5 Ubọchi nile nke nkwa nkwaputa-ya ọ dighi aguba gāgabiga n’isi-ya: rue ozùzù ubọchi nile, nke ọ nēkewaputara Jehova onwe-ya nsọ ka ọ gādi, ọ gēme ka ntutu agiri-isi-ya to ogologo.

6 Ubọchi nile ọ nēkewaputara Jehova onwe-ya ọ dighi madu nwuru anwu ọ gābiaru nso.

7 Ọ gaghi-emeru onwe-ya bayere nna-ya, ma-ọbu bayere nne-ya, ma-ọbu bayere nwa-nne-ya nwoke, maọbu bayere nwa-nne-ya nwayi, mb͕e ha nwuru; n’ihi na nkewaputa Chineke-ya di n’isi-ya.

8 Ubọchi nile nke nkewaputa-ya nsọ ka ọ diri Jehova.

9 Ma mb͕e onye nwuru anwu gānwu n’akuku-ya na ntabi-anya, na mberede, o we merua isi nkewaputa-ya; ọ gākọpu kwa isi-ya n’ubọchi anēme ya ka ọ di ọcha, n’ubọchi nke-asa ka ọ gakọpu ya.

10 N’ubọchi nke-asatọ ọ gēwetara onye-nchu-àjà nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.

11 Onye-nchu-àjà gēme otù ka ọ buru àjà-nmehie, me kwa nke-ọzọ ka ọ buru àjà-nsure-ọku, o gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, n’ihi nmehie nke ọ mehiere site na madu ahu nwuru anwu, o gēdo kwa isi-ya nsọ n’ubọchi ahu.

12 Ọ gēkewaputa-kwa-ra Jehova ubọchi nile nke nkewaputa-ya, weta kwa nwa-ebulu b͕ara otù arọ ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma: ma ubọchi mbu nile alawo n’iyì, n’ihi na nkewaputa-ya ruru árú.

13 Nka bu kwa iwu onye-Nazirait, n’ubọchi ozùzù nke ubọchi nile nke nkewaputa-ya: agēme ka ọ bia n’ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute:

14 ọ gēweta kwa nso Jehova onyinye-ya iji biaru nso, otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, nke zu-kwa-ra okè, ka ọ buru àjà-nsure-ọku, na otù nwa-nne-aturu nke b͕ara otù arọ, nke zu-kwa-ra okè, ka ọ buru àjà-nmehie, na otù ebulu zuru okè ka ọ buru àjà-udo,

15 na nkata achicha ekoghi-eko, ob͕e achicha nke utu ọka flour agwara manu, na mbadamba-achicha ekoghi-eko ufọdu nke etere manu, na onyinye-inata-iruọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha.

16 Onye-nchu-àjà gēweta kwa ha nso n’iru Jehova, me àjà-nmehie-ya, na àjà-nsure-ọku-ya:

17 ọ gēme kwa ebulu ahu ka ọ buru ihe àjà nke àjà-udo anāchuru Jehova, tiyere nkata achicha ekoghi-eko ahu: onye-nchu-àjà gēme kwa onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.

18 Onye-Nazirait ahu gākọpu kwa isi nke nkewaputa-ya n’ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, ọ gēwere kwa agiri-isi nke isi nke nkewaputa-ya, tiye ya n’elu ọku nke di n’okpuru ihe àjà nke àjà-udo ahu.

19 Onye-nchu-aja gēwere ọkwa-aka esiri esi nke ebulu ahu, na otù ob͕e achicha ekoghi-eko sitere na nkata ahu, na otù mbadamba-achicha ekoghi-eko, tiye ha n’elu ọbu-aka abua nke onye-Nazirait ahu, mb͕e ọ kọpusiri isi nke nkewaputa-ya:

20 onye-nchu-àjà gēfé kwa ha ibu àjà-ofufé n’iru Jehova; ihe nsọ ka ọ buru onye-nchu-àjà, tiyere okpukpu-obi nke àjà-ofufé, tiye-kwa-ra utaku-ukwu nke àjà-nbuli: emesia onye-Nazirait ahu gāṅu manya-vine.

21 Nka bu iwu onye-Nazirait onye nēkwe nkwa, na nke onyinye-ya iji biarue Jehova nso bayere nkewaputa-ya, nāgughi ihe aka-ya gēru: dika nkwa-ya si di, nke ọ nekwe, otú a ka ọ gēme n’iwu nkewaputa-ya.

22 Jehova we gwa Moses okwu, si,

23 Gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, okwu, si Otú a ka unu gāgọzi umu Israel; unu gāsi ha,

24 Jehova gọzie gi, debe gi:

25 Jehova me iru-Ya ka ọ mukwasi gi, Jehova me-kwa-ra gi amara:

26 Jehova bulie iru-Ya n’aru gi, nye gi udo.

27 Ha gātukwasi kwa aham n’aru umu Israel; Mu onwem gāgọzi kwa ha.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 7

1 O rue, n’ubọchi Moses guzosiri ebe-obibi ahu, te ya manu, do ya nsọ, na ihe-ya nile, na ebe-ichu-àjà na ihe-ya nile, mb͕e ọ tesiri ha manu, do ha nsọ;

2 na ndi-isi Israel, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, wetara ihe nso; ndi ahu bu ndi-isi ebo nile, ndi ahu bu ndi nēguzo n’isi ndi agukọtara agukọta:

3 ha we weta onyinye-ha iji biaru nso n’iru Jehova, ugbala isi nwere ihe-okpukpu, na ehi iri na abua; otù ugbala diri ndi-isi abua, otù ehi di-kwa-ra otù onye: ha we weta ha nso n’iru ebe-obibi ahu.

4 Jehova we gwa Moses okwu, si,

5 Nara ha n’aka-ha, ka ha we buru ihe iji fè òfùfè nke ulo-ikwū nzute; i gēwere kwa ha nye ndi Livai, nwoke ọ bula dika òfùfè-ya si di.

6 Moses we nara ugbala nile na ehi nile, nye ha ndi Livai.

7 Ugbala abua na ehi anọ ka o nyere umu Giashon, dika òfùfè-ha si di:

8 ugbala anọ na ehi asatọ ka o nye-kwa-ra umu Merari, dika òfùfè-ha si di, n’aka Itama nwa Eron, bú onye-nchu-àjà.

9 Ma ọ nyeghi umu Kohat: n’ihi na òfùfè nke ebe nsọ dikwasi ha; n’ubu ka ha nēbu ya.

10 Ndi-isi we weta nso onyinye irara ebe-ichu-àjà nye Chineke n’ubochi etere ya manu, ndi-isi ahu we weta nso onyinye-ha iji biaru nso n’iru ebe-ichu-àjà.

11 Jehova we si Moses, Otù onye-isi otù ubọchi, otù onye-isi otù ubọchi, ka ha gēweta nso onyinye-ha iji biaru nso, bayere ira ebe-ichu-àjà nye Chineke.

12 Onye nēweta nso onyinye-ya iji biaru nso n’ubọchi mbu bu Nahshon nwa Aminadab, nke ebo Juda:

13 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n’ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n’utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

14 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n’ọtùtù, juputara n’ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ;

15 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

16 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

17 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Nahshon nwa Aminadab.

18 N’ubọchi nke-abua Netanel nwa Zua, onye-isi Isaka, wetara ihe-ya nso:

19 o wetara nso onyinye-ya iji biaru nso: otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n’ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n’utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

20 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n’ọtùtù, juputara n’ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;

21 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

22 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

23 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Netanel nwa Zua.

24 N’ubọchi nke-atọ onye-isi umu Zebulun nwere, bú Eliab nwa Hilon, wetara ihe-ya nso;

25 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n’ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n’utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

26 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n’ọtùtù, juputara n’ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;

27 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

28 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

29 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Eliab nwa Hilon.

30 N’ubọchi nke-anọ onye-isi umu Reuben nwere, bú Elizua nwa Shedeua, wetara ihe-ya nso:

31 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n’ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n’utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

32 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n’ọtùtù, juputara n’ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;

33 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

34 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

35 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù, arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Elizua nwa Shedeua.

36 N’ubọchi nke-ise onye-isi umu Simeon nwere, bú Shelumiel nwa Zurishadai, wetara ihe-ya nso:

37 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n’ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n’utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

38 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n’ọtùtù, juputara n’ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;

39 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

40 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

41 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Shelumiel nwa Zurishadai.

42 N’ubọchi nke-isi onye-isi umu Gad nwere, bú Eliasaf nwa Deuel, wetara ihe-ya nso:

43 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n’ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n’utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

44 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n’ọtùtù, juputara n’ihe-nsure- ọku nēsì ísì utọ;

45 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

46 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

47 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Eliasaf nwa Deuel.

48 N’ubọchi nke-asa onye-isi umu Efraim nwere, bú Elishama nwa Amihud, wetara ihe-ya nso:

49 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n’ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n’utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

50 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n’ọtùtù, juputara n’ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;

51 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

52 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

53 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Elishama nwa Amihud.

54 N’ubọchi nke-asatọ onye-isi umu Manase nwere, bú Gameliel nwa Pedahzua, wetara ihe-ya nso:

55 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ iri na n’ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n’utu flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

56 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n’ọtùtù, juputara n’ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;

57 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

58 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

59 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Gameliel nwa Pedahzua.

60 N’ubọchi nke-iteghete onye-isi umu Benjamin nwere, bú Abidan nwa Gideoni, wetara ihe-ya nso:

61 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n’ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n’utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

62 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n’ọtùtù, juputara n’ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ;

63 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure ọku;

64 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

65 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Abidan nwa Gideoni.

66 N’ubọchi nke-iri onye-isi umu Dan nwere, bú Ahieza nwa Amishadai, wetara ihe-ya nso:

67 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù- ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n’ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n’utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

68 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n’ọtùtù, juputara n’ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;

69 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu; nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

70 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie:

71 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Ahieza nwa Amishadai.

72 N’ubọchi nke iri-na-otù onye-isi umu Asha nwere, bú Pagiel nwa Ọkran, wetara ihe-ya nso:

73 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọlaọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n’ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n’utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

74 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n’ọtùtù, juputara n’ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;

75 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

76 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

77 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Pagiel nwa Ọkran.

78 N’ubọchi nke-iri-na-abua onye-isi umu Naftali nwere, bú Ahira nwa Inan, wetara ihe-ya nso:

79 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n’ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: ha abua juputara n’utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

80 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n’ọtùtù, juputura n’ihe-nsure-ọku; nēsì ísì utọ;

81 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

82 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

83 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Ahira nwa Inan.

84 Nka bu onyinye nke ira ebe-ichu-àjà nye Chineke, n’ubọchi etere ya manu, site n’aka ndi-isi Israel: afere ọla-ọcha iri na abua, na ọkwa-nwusa ọla-ọcha iri na abua, na ngaji ọla-edo iri na abua:

85 afere ọla-ọcha ọ bula di ọgu shekel isi na iri n’ọtùtù, ọkwa-nwusa ọ bula di kwa ọgu shekel atọ na iri n’ọtùtù: ọla-ọcha nile nke ihe nile di nnù shekel isi n’ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di;

86 ngaji ọla-edo iri na abua ahu, juputara n’ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ, ha di shekel iri shekel iri n’ọtùtù-ha, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: ọla-edo nile nke ngaji di ọgu shekel isi n’ọtùtù-ha:

87 ehi nile iji chu àjà-nsure-ọku di oke-ehi iri na abua, ebulu-ya di iri na abua, umu-ebulu-ya nke b͕ara otù arọ di iri na abua, na onyinye-inata-iru-ọma-ha: nkpi iji chu àjà-nmehie di iri na abua:

88 ehi nile nke ihe àjà nke àjà-udo di orú oke-ehi na anọ, ebulu-ya di ọgu atọ, nkpi-ya di ọgu atọ, umu-ebulu-ya nke b͕ara otù arọ di ọgu atọ. Nka bu onyinye nke irara ebe-ichu-àjà nye Chineke, mb͕e etesiri ya manu.

89 Ma mb͕e Moses bara n’ulo-ikwū nzute ikpayere Ya uka, ọ we nu Olu ahu ka Ọ nāgwa ya okwu site n’elu ebe-nkpuchi-nmehie nke di n’elu ib͕e ihe-àmà ahu, site n’etiti cherubim abua ahu: O we gwa ya okwu.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 8

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Gwa Eron okwu, si ya, Mb͕e i nēweli oriọna asa ahu, na ncherita-iru nke iru ihe-idọba-oriọna ka oriọna asa ahu gēnye ìhè.

3 Eron we me otú a; na ncherita-iru nke iru ihe-idọba-oriọna ahu ka o weliri oriọna-ya nile, dika Jehova nyere Moses iwu.

4 Nka bu otú emere ihe-idọba-oriọna ahu, ihe akpuru akpu nke ọla-edo ka ọ bu; rue ukwu-ala-ya, ru kwa okoko-ya nile, ihe akpuru akpu ka ọ bu: dika ihe-ile-anya ahu si di nke Jehova mere ka Moses hu, otú a ka o mere ihe-idọba-oriọna ahu.

5 Jehova we gwa Moses okwu, si,

6 Weputa ndi Livai n’etiti umu Israel, me ka ha di ọcha.

7 Otú a ka i gēme ha, ime ka ha di ọcha: fesa ha miri nāsachapu nmehie, ka ha me kwa ka aguba gabiga n’anu-aru-ha nile, ka ha su kwa uwe-ha, me kwa onwe-ha ka ha di ọcha.

8 Ka ha were kwa nwa-oke ehi, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, bú utu ọka flour agwara manu, nwa-oke-ehi ọzọ ka i gēwere kwa iji chu àjà-nmehie.

9 I gēme kwa ka ndi Livai biaru nso n’iru ulo-ikwū nzute: i gākpọkọta kwa nzukọ nile nke umu Israel:

10 i gēme kwa ka ndi Livai biaru nso n’iru Jehova: umu Israel gēbikwasi ndi Livai aka-ha:

11 Eron gēfé ndi Livai n’iru Jehova ibu àjà-ofufé sitere n’umu Israel, ka ha we buru ndi gēfè òfùfè nke Jehova.

12 Ndi Livai gēbikwasi aka-ha n’isi oke-ehi abua ahu: gi me otù nime ha ka ọ buru àjà-nmehie, me ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ichuru Jehova, ikpuchiri ndi Livai nmehie-ha.

13 I gēguzo ndi Livai n’iru Eron, na n’iru umu-ya ndikom, fé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé ichuru Jehova.

14 I gēkewaputa kwa ndi Livai n’etiti umu Israel, ndi Livai gābu kwa ihe M’nwere.

15 Emesia ndi Livai gābà ifè ulo-ikwū nzute òfùfè: i gēme ka ha di ọcha, fé kwa ha ibu àjà-ofufé.

16 N’ihi na ndi enyesiworom ha nile ka ha bu site n’etiti umu Israel; n’ọnọdu umu nile ọ bula meghere àkpà-nwa, bú umu eburu uzọ muru madu nile nke umu Israel, ka M’wereworo ha n’Onwem.

17 N’ihi na Mu nwe umu nile eburu uzọ mu n’etiti umu Israel, ma n’etiti mmadu ma n’etiti anu-ulo: n’ubọchi m’tib͕uru umu nile eburu uzọ mu n’ala Ijipt ka M’doro ha nsọ nye Onwem.

18 Ewerewokwam ndi Livai n’ọnọdu umu nile eburu uzọ mu n’etiti umu Israel.

19 Ewerewom ndi Livai nye Eron, nye kwa umu-ya ndikom, dika ndi enyere enye, site n’etiti umu Israel, ifè òfùfè nke umu Israel n’ulo-ikwū nzute, na ikpuchiri umu Israel nmehie-ha: ka ihe-otiti we ghara idi n’etiti umu Israel, n’ibiaru-nso nke umu Israel nābiaru ebe nsọm.

20 Moses, na Eron, na nzukọ nile nke umu Israel, we me ndi Livai otú a: dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n’iwu bayere ndi Livai, otú a ka umu Israel mere ha.

21 Ndi Livai we wepu nmehie n’onwe-ha, su uwe-ha; Eron we fé ha ka ha buru àjà-ofufé n’iru Jehova; Eron we kpuchiere ha nmehie-ha ime ka ha di ọcha.

22 Emesia ndi Livai we ba ifè òfùfè-ha n’ulo-ikwū nzute n’iru Eron, na n’iru umu-ya ndikom: dika Jehova nyere Moses iwu bayere ndi Livai, otú a ka ha mere ha.

23 Jehova we gwa Moses okwu, si

24 Nka bu nke ndi Livai nwere: site n’onye b͕ara orú arọ na ise we gaba n’iru ha gābà ibu agha n’òfùfè nke ulo-ikwū nzute:

25 ma site n’onye b͕ara ọgu arọ abua na iri we gaba n’iru ha gēsi n’ibu-agha nke òfùfè ahu laghachi, ha agaghi-efè ọzọ;

26 ma ha gēso umu-nne-ha je ozi n’ulo-ikwū nzute, idebe ihe-ndebe, ma ọ dighi òfùfè ha gēfè. Otú a ka i gēme ndi Livai n’ihe-ndebe-ha.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 9

1 Jehova we gwa Moses okwu n’ọzara Sainai, n’arọ nke-abua nke nputa ha si n’ala Ijipt puta, n’ọnwa mbu, si,

2 Ka umu Israel me kwa ememe ngabiga na mb͕e-ya akara àkà.

3 N’ubọchi nke-iri-na-anọ n’onwa nka, n’etiti ehihie na anyasi, ka unu gēme ya na mb͕e-ya akara àkà: dika ukpuru-ya nile si di, na dika ikpé-ya nile si di, ka unu gēme ya.

4 Moses we gwa umu Israel okwu, si ha me ememe ngabiga ahu.

5 Ha we me ememe ngabiga ahu n’ọnwa mbu, n’ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu, n’etiti ehihie na anyasi, n’ọzara Sainai: dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n’iwu, otú a ka umu Israel mere.

6 Ma ndikom ufọdu di, ndi bu ndi ruru árú site n’ozu madu, ha apughi kwa ime ememe ngabiga ahu n’ubọchi ahu: ha we biaru nso n’iru Moses na n’iru Eron n’ubọchi ahu:

7 ndikom ahu we si ya, Ayi onwe-ayi bu ndi ruru árú site n’ozu madu: n’ihi gini ka anēb͕ochi ayi ka ayi we ghara iweta nso onyinye iji biaru nso Jehova na mb͕e-ya akara àkà n’etiti umu Israel?

8 Moses we si ha, Guzonu; ka m’we nu ihe Jehova gēnye n’iwu bayere unu.

9 Jehova we gwa Moses okwu, si,

10 Gwa umu Israel okwu, si, Nwoke ọ bula n’etiti unu ma-ọbu n’etiti ọb͕ọ-unu nile, mb͕e ọ gāru árú site na madu nwuru anwu, ma-ọbu mb͕e ọ nọ n’ije di anya, ọ gēme-kwa-ra Jehova ememe ngabiga:

11 n’ọnwa nke-abua n’ubọchi nke-iri-na-anọ n’etiti ehihie na anyasi ka ha gēme ya; tiyere achicha ekoghi-eko na ihe di iche iche nēlu ilu ka ha gēri ya:

12 ha agaghi-eme ka ihe fọdu site na ya rue ututu, ọ dighi kwa ọkpukpu ha gētiji nime ya: dika ukpuru nile nke ngabiga ahu si di ka ha gēme ya.

13 Ma nwoke nke di ọcha, nke nānọghi kwa n’ije, ma ọ rapuwo ime ememe ngabiga, agēbipu kwa madu ahu n’etiti umu-nna-ya: n’ihi a o wetaghi nso onyinye iji biaru nso Jehova na mb͕e-ya akara àkà, nwoke ahu gēbu nmehie-ya.

14 Ma mb͕e ọbìa gānọ n’etiti unu dika ọbìa, me-kwa-ra Jehova ememe ngabiga; dika ukpuru ngabiga ahu si di, na dika ikpé-ya si di, otú a ka ọ gēme: otù ukpuru ka unu gēnwe, ma ọbìa, ma onye amuru n’ala.

15 N’ubọchi eguzoro ebe-obibi ahu ọtọ igwe-oji ahu kpuchiri ebe-obibi, ọbuna ulo-ikwū nzute: ma n’anyasi ọ di n’elu ebe-obibi ahu dika ọku, n’ile ya anya, rue ututu.

16 Otú a ka ọ di mb͕e dum: igwe-oji ahu nēkpuchi ya, ya na ọku n’abali, n’ile ya anya.

17 Ma ọ di ka nrigo nke igwe-oji ahu site n’elu Ulo-ikwū si di, emesia umu Israel we bulie ije: ọ bu kwa n’ebe igwe-oji ahu bi, n’ebe ahu ka umu Israel nāma ulo-ikwū-ha.

18 N’okwu-ọnu Jehova ka umu Israel nēbuli ije, ọ bu kwa n’okwu-ọnu Jehova ka ha nāma ulo-ikwū-ha: ubọchi nile igwe-oji ahu nēbi n’elu ebe-obibi ahu ha nānọdu n’ọmuma-ulo-ikwū.

19 Mb͕e igwe-oji ahu nānọgide n’elu ebe-obibi ahu ọtutu ubọchi, umu Israel we debe ihe-ndebe nke Jehova, ha ebulighi kwa ije.

20 Mb͕e ufọdu di mb͕e igwe-oji ahu nānọ ubọchi ole-na-ole n’elu ebe-obibi ahu; n’okwu-ọnu Jehova ka ha nānọdu n’ọmuma-ulo-ikwū, ọ bu kwa n’okwu-ọnu Jehova ka ha nēbuli ije.

21 Mb͕e ufọdu di kwa mb͕e igwe-oji ahu nānọ site n’anyasi rue ututu; ma mb͕e igwe-oji ahu rigoro n’ututu, ha we bulie ije: ma n’ehihie ma n’abali, mb͕e igwe-oji ahu rigoro, ha we bulie ije.

22 Ma asi na ọ bu ubọchi abua, ma-ọbu otù ọnwa, ma-ọbu otù arọ, ka igwe-oji ahu nānọgide n’elu ebe-obibi ahu, ibi n’elu ya, umu Israel nānọdu n’ọmuma-ulo-ikwū-ha, ha ebulighi kwa ije: ma mb͕e emere ka ọ rigo, ha buliri ije.

23 N’okwu-ọnu Jehova ha nāma ulo-ikwū-ha, ọ bu kwa n’okwu-ọnu Jehova ka ha nēbuli ije: ihe-ndebe nke Jehova ka ha debere, n’okwu-ọnu Jehova n’aka Moses.

Categories
ỌNU-ỌGUGU

ỌNU-ỌGUGU 10

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Mere onwe-gi opì ọla ọcha abua; ihe akpuru akpu ka i gēme ha: ha gābu-kwa-ra gi ihe bayere nkpọkọta nzukọ Israel, na ihe bayere nbuli-ije nke omuma-ulo-ikwū nile ha.

3 Mb͕e ha gēwere ha fùa, nzukọ Israel nile gēzukọ n’ebe i nọ rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.

4 Ma ọ buru na otù ka ha were fùa, ndi-isi, bú ndi-isi nke usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel, gēzukọ kwa n’ebe i nọ.

5 Mb͕e unu gāfù opì ka ọ we dasie uda ike, ọmuma-ulo-ikwū nile nke nāma ulo-ikwū-ha n’akuku Iru-anyanwu gēbuli kwa ije.

6 Mb͕e unu gāfù opì ub͕ò nke-abua ka ọ we dasie uda ike, ọmuma-ulo-ikwū nile nke nāma ulo-ikwū-ha n’akuku Ndida gēbuli kwa ije: ha gāfù opì ka ọ we dasie uda ike bayere nbuli-ije nile ha.

7 Ma n’ikpọkọta nkpọkọta Israel unu gāfù opì, ma unu emela ka ọ dasie uda ike.

8 Ọ bu umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gēwere opì abua ahu fua; ha gābu-kwa-ra unu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ nile unu.

9 Ọzọ, mb͕e unu nēbu agha n’ala-unu megide onye-nkpab͕u nākpab͕u unu, unu gēwere opì me ka ha dasie uda ike; agēcheta kwa unu n’iru Jehova, bú Chineke-unu, agāzọputa kwa unu n’aka ndi-iro-unu.

10 Ọ bu kwa n’ubọchi ọṅu-unu, na na mb͕e nile unu akara àkà, na nime nmalite ọnwa nile unu, ka unu gēwere opì abua ahu fùa n’elu àjà-nsure-ọku nile unu, na n’elu ihe àjà nke àjà-udo nile unu; ha gābu-kwa-ra unu ihe-ncheta n’iru Chineke-unu; Mu onwem bu Jehova, Chineke-unu.

11 O rue n’arọ nke-abua, n’ọnwa nke-abua, n’ubọchi nke-orú n’ọnwa ahu, na igwe-oji ahu siri n’elu ebe-obibi nke ihe-àmà ahu rigo.

12 Umu Israel we si n’ọzara Sainai bulie ije dika nbuli-ije nile ha si di; igwe-oji ahu we nọdu n’ọzara Peran.

13 Ma ha buru uzọ bulie ije n’okwu-ọnu Jehova n’aka Moses.

14 Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Juda buru uzọ bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Nahshon nwa Aminadab nọ n’isi usu-ndi-agha-ya.

15 Onye nọ n’isi usu-ndi-agha nke ebo umu Isaka bu Netanel nwa Zua.

16 Onye nọ n’isi usu-ndi-agha nke ebo umu Zebulun bu Eliab nwa Hilon.

17 Ewe weda ebe-obibi ahu; umu Giashon na umu Merari, ndi nēbu ebe-obibi ahu, we bulie ije.

18 Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Reuben we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Elizua nwa Shedeua nọ n’isi usu-ndi-agha-ya.

19 Onye nọ n’isi usu-ndi-agha nke ebo umu Simeon bu Shelumiel nwa Zurishadai.

20 Onye nọ n’isi usu-ndi-agha nke ebo umu Gad bu Eliasaf nwa Deuel.

21 Ndi Kohat we bulie ije, nēbu ebe nsọ ahu: ma ndi ọzọ guzoro ebe-obibi ahu ọtọ rue ọbibia-ha.

22 Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Efraim we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Elishama nwa Amihud nọ n’isi usu-ndi-agha-ya.

23 Onye nọ n’isi usu-ndi-agha nke ebo umu Manase bu Gameliel nwa Pedahzua.

24 Onye nọ n’isi usu-ndi-agha nke ebo umu Benjamin bu Abidan nwa Gideoni.

25 Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Dan, nke nọ n’azu ọmuma-ulo-ikwū nile, we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Ahieza nwa Amishadai nọ n’isi usu-ndi-agha-ya.

26 Onye nọ n’isi usu-ndi-agha nke ebo umu Asha bu Pagiel nwa Ọkran.

27 Onye nọ n’isi usu-ndi-agha nke ebo umu Naftali bu Ahira nwa Inan.

28 Ndia bu nbuli-ije nke umu Israel, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di; ha we bulie ije.

29 Moses we si Hobab, nwa Reuel onye Midian, bú nna nwunye Moses, Ndi nēbuli ije ka ayi bu rue ebe ahu nke Jehova kwuru okwu bayere ya, si, Nke ahu ka M’gēnye unu: soro ayi je, ayi gēme kwa gi nma: n’ihi na Jehova ekwuwo ezi ihe bayere Israel.

30 Ọ we si ya, M’gaghi-eje; kama alam na umu-nnam ka m’gālakuru.

31 Ọ we si, Biko, arapula ayi; n’ihi na i mara ọmuma-ulo-ikwū-ayi n’ọzara, i gābu-kwa-ra ayi anya.

32 O gēru kwa, mb͕e i soro ayi je, o gēru kwa, na ezi ihe ahu nke Jehova gēme ayi nma ya, ayi gēme kwa gi nma.

33 Ha we si n’ugwu Jehova bulie ije-ha je ije ubọchi atọ; ib͕e ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova nēbuli kwa ije n’iru ha ije ubọchi atọ, ileputara ha ebe izu-ike

34 Igwe-oji nke Jehova we di n’elu ha n’ehihie, mb͕e ha si n’ọmuma-ulo-ikwū bulie ije.

35 O rue, nime nbuli-ije ib͕e ahu, na Moses nāsi, Bilie, Jehova, ka ndi-iro-Gi b͕asa; ka ndi nākpọ Gi asì b͕apu kwa n’iru Gi.

36 Ma mb͕e o zuru ike, ọ nāsi, Jehova, laghachikute ọtutu ìgwè madu ndia, bú usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Israel.