Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 1

1 Ederem akwukwọ mbu, Teofilọs, banyere ihe nile Jisus malitere ime na izí,

2 rue ubọchi anara Ya n’elu, mb͕e O sitere na Mọ Nsọ nyesia ndi-ozi-Ya ndi Ọ rọputarari iwu:

3 ndi O ji kwa ọtutu uzọ nādighi igọ agọ che Onwe-ya n’iru ha na ndu mb͕e Ọ husiri ahuhu, ebe O mere ka ha nāhu Ya anya n’ogologo ọgu ubọchi abua, O nēkwu kwa ihe nile bayere ala-eze Chineke:

4 mb͕e Ya na ha zukọrọ O we nye ha iwu ka ha ghara isi na Jerusalem pua, kama ka ha chere nkwa nke Nna-Ya, nke unu nuru n’ọnum, ka O kwuru:

5 n’ihi na Jọn jiri miri me baptism n’ezie; ma agēji Mọ Nsọ me unu baptism mb͕e ọtutu ubọchi nāgaghi-agabiga site n’ub͕u a.

6 Ya mere mb͕e ha b͕akọrọ, ha jua Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ̀ bu n’oge a ka I nēnyeghachi Israel ala-eze?

7 O we si ha, Ọ bughi ihe diri unu ima oge ma-ọbu ubọchi, nke Nnam debere n’ike nke aka Ya.

8 Ma unu gānata ike, mb͕e Mọ Nsọ gābiakwasiwori unu: unu gābu kwa ndi-àmàmnime Jerusalem, na nime Judia na Sameria nile, ru kwa ebe uwa sọturu.

9 Mb͕e O kwusiri okwu ndia, mb͕e ha nēle anya, ewe welie Ya elu; igwe-oji we nara Ya, Ọ pua n’anya-ha.

10 Mb͕e ha nēlegide anya n’elu-igwe ka Ọ nāga n’elu, le, ndikom abua we guzo ha nso yiri uwe ọcha;

11 ndi si-kwa-ara, Ndikom nke Galili, gini mere unu nēguzo nēle anya n’elu-igwe? Jisus nka, Onye anapuru n’ebe unu nọ rigo n’elu-igwe, gābia n’otù aka ahu dika unu kiriri Ya ka Ọ nāga n’elu-igwe.

12 Mb͕e ahu ha siri n’ugwu anākpọ Olivet, nke di Jerusalem nso, ije nke otù ubọchi-izu-ike, laghachi na Jerusalem.

13 Mb͕e ha batara n’obodo, ha we rigo n’ime-ulo di n’elu ulo, ebe ha nānọ; Pita na Jọn na Jemes na Andru, Filip na Tomas, Batọlọmiu na Matiu, Jemes nwa Alfiọs, na Saimon Zilotis, na Judas nwa Jemes.

14 Ndia nile ji otù obi nọgidesi ike n’ekpere, ha na ndinyom ufọdu, na Meri nne Jisus, na umu-nne-Ya.

15 Na mb͕e ahu Pita we bilie n’etiti umu-nna nime Kraist, si, (ìgwè madu ndi nọkọrọ n’otù di kwa, ihe ra ka ọgu madu isi),

16 Umu-nnam, ihe edeworo n’akwukwọ nsọ aghaghi imezu, nke Mọ Nsọ kwuru n’oge gara aga site n’ọnu Devid banyere Judas, onye mesiri buru onye-ndù ndi jidere Jisus.

17 N’ihi na aguru ya-ri n’etiti ayi, o we keta òkè-ya n’ije-ozi a.

18 (Ya mere onye a sitere n’ugwọ-ọlu nke ajọ omume-ya nata otù iberibe ala; o we da su isi n’ala, tipue afọ-ya, ngiri-afọ-ya nile we nuputa.

19 Ọ we buru ihe ndi nile bi na Jerusalem mara; ya mere eji akpọ iberibe ala ahu Akeldama n’asusu-ha, nke ahu bu, Iberibe ala ọbara.)

20 N’ihi na edewo ya n’akwukwọ Abù ọma, si,

Ka ebe-ulo-ikwū-ya ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu,

Ka onye ọ bula ghara kwa ibi na ya: na,

Ka onye di iche nara ya ọlu-nlekọta-ya.

21 Ya mere otù onye nime ndikom ndi soro ayi n’oge nile Onye-nwe-ayi Jisus bàra nime pu kwa n’èzí n’etiti ayi,

22 nāmalite na baptism nke Jọn, rue ubọchi anapuru Ya n’ebe ayi nọ rigo n’elu-igwe, otù onye nime ndia aghaghi iso ayi buru onye-àmà nke nbilite- n’ọnwu-Ya.

23 Ha we guzo madu abua, Josef anākpọ Basabas, onye akpọ-kwa-ra Justọs, na Mataias.

24 Ha we kpe ekpere, si, Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, Onye mara obi madu nile, gosi ayi onye ahu I rọputara nime madu abua ndia,

25 inara ọnọdu n’ije-ozi na ọlu onye-ozi a, nke Judas jehiere nime ya, ka o we ga n’ebe nke aka ya.

26 Ha we fere ha nzà; nzà ahu we ma Mataias; ewe gua ya nime ndi-ozi iri na otù ahu.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 2

1 Mb͕e ubọchi Pentikọst nēzu okè, ha nile we nọkọ n’otù ebe.

2 Na mberede ùzù, dika nke oké ifufe nke nēfesi ike, we site n’elu-igwe, o we juputa ulo ahu dum ebe ha nānọdu ala.

3 Ewe me ka ha hu ire, dika nke ọku, nēkesa onwe-ha; o we nọkwasi ha nile n’otù n’otù.

4 Ha nile we juputa na Mọ Nsọ, ha we malite ikwu okwu n’asusu di iche, dika Mọ ahu nēnye ha ike ikwuwa okwu.

5 Ma ndi-Ju ufọdu bi na Jerusalem, ndi nātu egwu Chineke, ndi si na mba nile di n’okpuru elu-igwe bia.

6 Ma mb͕e ùzù ahu putura, ọra madu b͕akọrọ, o we b͕a ha ghari, n’ihi na onye ọ bula n’etiti ha nānu ka ha nēkwu okwu n’asusu nke aka ya.

7 Ibobo we nwua ha nile n’aru, o ju-kwa-ra ha anya, ha si, Le, ndia nile ndi nēkwu okwu, hà abughi ndi Galili?

8 Àyi onwe-ayi si kwa aṅa nu n’otù n’asusu nke aka ayi, nke amuru ayi nime ya?

9 Ndi Patia na ndi Midia na ndi Ilam, na ndi bi na Mesọ-pọtemia, ndi bi kwa nime Judia na Kapa-dọsia, nime Pọntọs na Esia,

10 nime Frijia na Pamafilia, nime Ijipt na akuku Libia di Sairini nso, na ndi-ọbìa si na Rom bia, ma ndi-Ju ma ndi nēso uzọ ndi-Ju,

11 ndi Krit na ndi Arebia, ayi nānu ka ha nēkwu okwu n’asusu-ayi bayere oké ọlu nile nke Chineke.

12 Ibobo we nwua ha nile n’aru, ha nwe-kwa-ra obi abua, nāsirita ibe-ha, Isi ihe a bu gini?

13 Ma ndi ọzọ nēme ha ihe-ọchì, si, Ha ṅujuworo manya-vine ọchu afọ.

14 Ma Pita guzoro, ya na ndi-ozi iri na otù ahu, we welie olu-ya elu, gwawa ha okwu, si, Ndikom nke Judia, na unu nile ndi bi na Jerusalem, maranu nka, ge-kwa-nu nti n’okwum.

15 N’ihi na manya abàghi ndia n’anya, dika unu onwe-unu nēchè; ebe ọ bu oge hour nke-atọ n’ututu;

16 kama nka bu nke ekwuworo site n’ọnu Joel onye-amuma, si,

17 Ọ gēru kwa na mb͕e ikpe-azu, ka Chineke kwuru,

M’gāwusa ufọdu nime Mọm n’aru anu-aru nile, bú madu:

Umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma,

Umu-okorọbia-unu gāhu kwa ọhù,

Ndi-okenye-unu gārọ kwa nrọ:

18 E, n’aru ndi-orùm ndikom na n’aru ndi-orùm ndinyom

Ka M’gāwusa ufọdu nime Mọ nkem na mb͕e ahu; ha gēbu kwa amuma.

19 M’gēnye kwa ọlu-ebube n’elu-igwe di n’elu,

Na ihe-iriba-ama n’elu ala di n’okpuru ya;

Ọbara, na ọku, na alulu anwuru-ọku:

20 Anyanwu gāb͕anwe ghọ ọchichiri,

Ọnwa gāb͕anwe kwa ghọ ọbara,

Tutu ubọchi Onye-nwe-ayi abia,

Bú oké ubọchi ahu nke nāputa ìhè:

21 O gēru kwa, na onye ọ bula nke gākpọku aha Onye-nwe-ayi, agāzọputa ya.

22 Ndikom nke Israel, nurunu okwu ndia: Jisus Onye Nazaret, bú Nwoke Nke Chineke gosiworo unu site n’ọlu di ike na ọlu-ebube na ihe-iriba-ama, nke Chineke mere site n’aka-Ya n’etiti unu, dika unu onwe-unu matara:

23 Onye a, ebe ewere Ya nye site n’ìzù akara àkà nke Chineke na ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara, Onye a ka unu kpọgidere n’obe b͕u kwa site n’aka ndi nāmaghi iwu-ayi:

24 Onye Chineke mere ka O si n’ọnwu bilie, mb͕e Ọ tọpusiri ihe-nb͕u nke ọnwu: n’ihi na ọnwu apughi ijide Ya.

25 N’ihi na Devid nēkwu okwu bayere Ya, si,

Anamahuri Onye-nwe-ayi n’irum mb͕e nile;

N’ihi na Ọ nọ n’aka-nrim, ka aghara ime ka M’me nkpatu:

26 N’ihi nka ọ tọrọ obim utọ, obi nātọ kwa irem utọ nke-uku;

Ọzọ kwa, anu-arum gēbi kwa n’olile-anya:

27 N’ihi na I gaghi-arapu nkpuru-obim nime Hedis,

I gaghi-enye kwa Onye nke Gi di ọcha n’obi ka Ọ hu ire-uré.

28 I mere ka M’mara uzọ ndu;

I gēji iru-Gi me ka M’juputa n’ọṅù.

29 Umu-nnam, o ziri ezi iwere nkwuwa-okwu gwa unu okwu bayere nna uku ayi Devid, na ọ nwuru, eli kwa ya, ílì-ya di kwa n’etiti ayi rue ubọchi ta.

30 Ya mere ebe ọ bu onye-amuma, mata kwa na Chineke ṅuru ya-ri iyi, na Ọ gēwere otù Onye nime ndi bu nkpuru si ya n’afọ puta me ka Ọ nọkwasi oche-eze-ya;

31 ebe o buru uzọ hu nka a o kwuru okwu bayere nbilite-n’ọnwu nke Kraist ahu, na arapughi Ya nime Hedis, anu-aru-Ya ahughi kwa ire-uré.

32 Jisus nka ka Chineke mere ka O si n’ọnwu bilie, nke ayi onwe-ayi nile bu ndi-àmà-ya.

33 Ya mere, ebe eweliri Ya elu site n’aka-nri Chineke, ebe Ọ nata-kwa-ra n’aka Nna-Ya nkwà ahu, bú Mọ Nsọ, Ọ wusara nka unu onwe-unu nāhu nānu kwa.

34 N’ihi na Devid arigoghi n’elu-igwe: ma ya onwe-ya si,

Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem, Nọdu ala n’aka-nrim,

35 Rue mb͕e M’gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi nke ukwu-Gi abua.

36 Ya mere ka ulo Israel nile mazue, na Chineke mere Ya ka Ọ buru Onye-nwe-ayi na Kraist-ayi, bú Jisus ahu Onye unu onwe-unu kpọgidere n’obe.

37 Ma mb͕e ha nuru nke a, ewe dua ha nime obi-ha, ha we si Pita na ndi-ozi fọduru, Umu-nna-ayi, gini ka ayi gēme?

38 Pita we si ha, Chègharianu, ka eme kwa unu nile baptism n’otù n’otù n’aha Jisus Kraist, ka ewe b͕aghara nmehie nile unu; unu gānata kwa onyinye a, bú Mọ Nsọ.

39 N’ihi na unu ka nkwa nka diri, na umu-unu, na ndi nile nọ n’ebe di anya, ka ha ra, bú ndi Onye-nwe-ayi Chinike-ayi gākpọtara Onwe-ya.

40 O ji kwa ọtutu okwu ọzọ kwusie okwu ike, nāriọ kwa ha, si, Zọputanu onwe-unu n’ọb͕ọ a di nb͕agọ.

41 Ya mere ndi nāra okwu-ya nke-ọma, emere ha baptism: n’ubọchi ahu ewe tukwasiri ha ihe ra ka nnù madu asa na ọgu iri.

42 Ha we nānọgidesi ike n’ozizí ndi-ozi na nnwekọ, n’inyawa-achicha-ha na ekpere-ha.

43 Madu nile we tua egwu n’otù n’otù: eme-kwa-ra ọtutu ọlu-ebube na ihe-iriba-ama site n’aka ndi-ozi.

44 Ndi nile ndi kwere na Kraist nọkọ-kwa-ra, ha nwekọ-kwa-ra ihe nile;

45 ha we re ihe nile ha natara na ihe nile ha nwere, we kesa ha nye madu nile, dika nkpà diri onye ọ bula.

46 Ha ji kwa otù obi nānọgidesi ike n’ulo uku Chineke kwa-ubọchi, ha nānyawa kwa achicha n’ulo-ha, we nara ihe-oriri-ha n’obi utọ na obi nke aghughọ nādighi ya,

47 ha nēto Chineke, ihe-ha nātọ kwa ndi-Ju dum utọ. Onye-nwe-ayi nātukwasi-kwa-ra ha kwa-ubọchi ndi anāzọputa.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 3

1 Ma Pita na Jọn nārigo n’ulo uku Chineke n’oge hour ekpere, bù oge hour nke-iteghete.

2 Anēbute kwa otù nwoke nke dara ngwurọ site n’afọ nne-ya, onye ha nātọb͕ọ kwa-ubọchi na nso ọnu-uzọ ahu nke ulo uku Chineke nke anākpọ Ọnu-uzọ Ọma, iriọ onyinye-ebere n’aka ndi nābà nime ulo uku Chineke;

3 onye, mb͕e ọ huru Pita na Jọn ka ha gaje ibà n’ulo uku Chineke, ọ kpe ekpere inata onyinye-ebere.

4 Ma Pita, ka ya na Jọn nēlegide ya anya, ọ si, Le ayi anya.

5 O we riba ha ama, nēle anya inata ihe n’aka-ha.

6 Ma Pita siri, Ọ dighi ọla-ọcha na ọla-edo m’nwere; ma ihe m’nwere, nke ahu ka m’nēnye gi. N’aha Jisus Kraist Onye Nazaret, je ije.

7 O we jide ya n’aka-nri, palie ya: ngwa ngwa ukwu-ya abua na nkwonkwo-ukwu-ya we nwe ume.

8 O we wulie elu, guzo, je kwa ije; o we so ha ba n’ulo uku Chineke, nēje ije, nāwuli kwa, nēto kwa Chineke.

9 Ndi-Ju nile we hu ya ka ọ nēje ije nēto kwa Chineke;

10 ha we mata ya, na ọ bu onye ahu nke nọduru n’Ọnu-uzọ-ama Ọma nke ulo uku Chineke inata onyinye-ebere: o we b͕a ha ghari nke-uku, ibobo nwubiga-kwa-ra ha ókè n’aru, n’ihi ihe emeworo ya-ri.

11 Ma mb͕e o nējide Pita na Jọn aka, ndi-Ju nile b͕akọrọ n’ebe ha nọ n’ìbà nke anākprọ ìbà Solomon, ibobo nwuru ha n’aru nke-uku.

12 Ma mb͕e Pita huru ya, ọ zara ndi-Ju, si, Ndikom nke Israel, gini mere ihe a nēju unu anya? ma-ọbu gini mere unu nēlegide ayi anya, dika ọ bu site n’ike nke aka ayi? ma-ọbu dika ayi onwe-ayi nāsọpuru Chineke ka ayi meworo ya ka ọ je ije?

13 Chineke nke Abraham, na nke Aisak, na nke Jekob, Chineke nke nna-ayi-hà, nyere Onye ahu nējere Ya ozi otuto, bù Jisus; Onye unu onwe-unu rara nye, gọnari kwa n’iru Pailat, mb͕e o kpereri ikpè irapu Ya.

14 Ma unu onwe-unu gọnariri Onye Nsọ na Onye Ezi Omume ahu, we riọ ka ewere amara nye unu ob͕u-madu,

15 unu we b͕ue Onye ahu nke nēdubà madu na ndu; Onye Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie; Onye ayi onwe-ayi bu ndi-àmà-Ya.

16 Site kwa n’okwukwe ekwere n’aha-Ya ka aha-Ya nyere nwoke a ume, onye unu nēle anya mata kwa: e, okwukwe ahu nke sitere n’aka-Ya mere ka aru-ya dizu nma n’iru unu nile.

17 Ma ub͕u a, umu-nnam, amataram na unu mere ya n’amaghi-ihe, dika ndi-isi-unu me-kwa-ra.

18 Ma ihe nile Chineke buru uzọ kwusa site n’ọnu ndi-amuma-Ya nile, na Kraist-Ya gāhu ahuhu, O mezuru ha otù a.

19 Ya mere chègharianu, chighari-kwa-nu, ka ewe hichapu nmehie nile unu, ka oge inwe ume ndu we si n’iru Onye-nwe-ayi bia otù a;

20 ka O we zite kwa Kraist ahu Onye eburu uzọ rọputara unu, bù Jisus:

21 Onye elu-igwe aghaghi inara nke-ọma rue oge agēme ka ihe nile di ka ha di na mbu, bù oge nke Chineke kwuru okwu bayere ha site n’ọnu ndi-amuma-Ya di nsọ ndi sitere na nmalite oge a.

22 Moses kwuru n’ezie, si, Onye-nwe-ayi Chineke gēme ka Onye-amuma, Nke di ka mu onwem, biliere unu site n’etiti umu-nne-unu; Onye ahu ka unu gēge nti n’ihe nile, ka ha ra, bù nke Ọ gāgwa unu.

23 Ma ọ gēru, na madu ọ bula, nke nāgaghi-ege nti Onye-amuma ahu, agēkpochapu ya n’etiti ndim.

24 E, ndi-amuma nile site na Samuel na ndi soro ya n’azu, ka ha ra, bù ndi kwuru, ha kwusa-kwa-ra okwu banyere ubọchi nda.

25 Unu onwe-unu bu umu ndi-amuma, na umu ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Chineke na nna-unu-hà b͕ara, mb͕e Ọ siri Abraham, Ọ bu kwa na Nkpuru-gi ka agāgọzi ab͕uru niile nke uwa.

26 Unu bu ndi Chineke buru uzọ were Ya zitere, mb͕e O mere ka O bilie, bù Onye ahu nējere Ya ozi, igọzi unu, n’ichighari unu nile n’otù n’otù ka unu rapu ajọ ihe-unu.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 4

1 Ma mb͕e ha nāgwa ndi-Ju okwu, ndi-nchu-àjà na ọchi-agha nke ulo uku Chineke na ndi-Sadusi biakwasiri ha,

2 ebe ike gwuru ha nọ̄ n’ihi na ha nēzi ndi-Ju ihe, nēkuwsa kwa nime Jisus nbilite site na ndi nwuru anwu.

3 Ha we tukwasi ha aka, tiye ha n’ulo-nkpọrọ rue echi-ya: n’ihi na ọ bu anyasi ub͕u a.

4 Ma ọtutu n’etiti ndi nuru okwu-ha kwere; ọnu-ọgugu ndikom ahu we rue ihe ra ka nnù iri na nnù abua na ọgu iri.

5 O we rue n’echi-ya, na ndi-isi-ha na ndi-okenye-ha na ndi-ode-akwukwọ-ha zukọrọ na Jerusalem;

6 Anas onye-isi-nchu-àjà nọ kwa n’ebe ahu, na Kaiafas, na Jọn, na Aleksanda, na ka ha ra, bú ndi sitere n’ikwu nke onye-isi-nchu-àjà.

7 Mb͕e ha guzosiri ha n’etiti, ha jua ha, si, N’àha ike gini, ma-ọbu n’aha gini, ka unu onwe-unu mere nka?

8 Mb͕e ahu Pita, ebe o juputara na Mọ Nsọ, ọ si ha, Ndi-isi ndi-Ju, na ndi-okenye,

9 ọ buru na ekpe ayi onwe-ayi ta ikpé bayere ọlu ọma aluru n’aru onye aru nādighi ya ike, ihe eji zọputa onye a;

10 ka eme ka unu nile na ndi Israel nile mara, na ọ bu n’aha Jisus Kraist Onye Nazaret, Onye unu onwe-unu kpọgidere n’obe, Onye Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ọ bu n’aha nka ka onye a ji aru di nma guzo n’iru unu n’ebe a.

11 Onye ahu bu nkume nke unu, bú ndi nēwu ulo, kpọrọ ihe-efu, nke ghọrọ isi nkuku ulo.

12 Nzọputa adighi kwa n’onye ọ bula ọzọ: n’ihi na aha ọzọ di iche adighi kwa n’okpuru elu-igwe, nke enyeworo n’etiti madu, nke anāghaghi izọputa ayi nime ya.

13 Ma mb͕e ha huru nkwuwa-okwu nke Pita na Jọn, mb͕e ha ghọta-kwa-ra na ha bu ndi nāmaghi ihe na ndi nāmutaghi akwukwọ ri nne, o ju ha anya; ha we mata ha, na ha na Jisus anọwori.

14 Ebe ha hu-kwa-ra nwoke ahu nke emereri ka aru di ya ike ka ya na ha nēguzo, ha enweghi ihe ikwugide ya.

15 Ma mb͕e ha gwasiri ha ka ha si na nnọkọ-ikpé-ha pua n’èzí, ha b͕a ìzù n’etiti onwe-ha,

16 si, Gini ka ayi gēme madu ndia? n’ihi na ọ putara ìhè nye ndi nile bi na Jerusalem, na ọ bu ezie na emewo ihe-iriba-ama amara nke-ọma site n’aka-ha; ayi apughi kwa igọ ya.

17 Ma ka o we ghara ib͕asa kari n’etiti ndi-Ju, ka ayi bara ha nba, ka ha ghara igwa madu ọ bula okwu n’aha nka site n’ub͕u a.

18 Ha we kpọ ha, nye ha iwu ka ha ghara ikwu okwu ma-ọli ma-ọbu izí ihe n’aha Jisus.

19 Ma Pita na Jọn zara, si ha, Kpenu ma ọ bu ihe ziri ezi n’anya Chineke inu olu-unu kari olu Chineke:

20 n’ihi na ayi onwe-ayi apughi ighara ikwu ihe nile ayi huru nu kwa.

21 Ma mb͕e ha basiri ha nba ọzọ, ha rapu ha ka ha la, ebe ha nāhughi uzọ ha gēsi me ka ha hu ahuhu-nmehie, n’ihi ndi-Ju; n’ihi na madu nile nēnye Chineke otuto bayere ihe emeworo.

22 N’ihi na nwoke a b͕ara kari ọgu arọ abua, bú onye emereri ihe-iriba-ama nka n’aru-ya, bú ime ka aru-ya di ike.

23 Ma mb͕e arapusiri ha, ha biakutere ndi nke aka ha, we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye siri ha-ri.

24 Ma mb͕e ha nuru ya, ha were otù obi welie olu-ha kpọkue Chineke, si, Onye-nwe-ayi, Gi onwe-gi bu Onye kère elu-igwe na ala na oké osimiri, na ihe nile di ha nime:

25 Onye sitere n’aka Mọ Nsọ, site n’ọnu nna-ayi Devid onye nējere Gi ozi, si,

N’ìhi gini ka mba nile mere oké nkpọtu,

Ndi nile di n’uwa nātughari kwa ihe-efu uche?

26 Ndi-eze uwa guzoro onwe-ha n’otù,

Ndi-isi zukọ-kwa-ra,

Imegide Onye-nwe-ayi, na imegide Kraist-Ya:

27 n’ihi na ọ bu ezie na nime obodo a Herod na Pọntiọs Pailat, ha na ndi mb͕a ọzọ na ndi Israel nile, zukọrọ imegide Onye Nsọ ahu nējere Gi ozi, bú Jisus, onye I tere manu n’isi,

28 ka ha me ihe nile, ka ha ra, bú nke aka-Gi na ìzù-Gi buru uzọ ka àkà ka ha puta.

29 Ub͕u a, Onye-nwe-ayi, le kwa iba-nba-ha anya: nye kwa ndi-orù-Gi ike ka ha were nkwuwa-okwu nile kwue okwu-Gi,

30 n’iseti aka-Gi ime ka aru madu di ike; ka ewe me kwa ihe-iriba-ama na ọlu-ebube site n’aha Onye Nsọ ahu nējere Gi ozi, bú Jisus.

31 Mb͕e ha riọsiri aririọ, ewe me ka ebe ha nọ na nzukọ me nkpatu; ha nile we juputa na Mọ Nsọ, we were nkwuwa-okwu nēkwu okwu Chineke.

32 Ma ọra ndi kwere na Kraist nwere otù obi na otù nkpuru-obi: ọ dighi kwa otù onye n’etiti ha nāsi na ihe ọ bula nime ihe nile o nwere bu nke aka ya; kama ha nwekọrọ ihe nile.

33 Ọ bu kwa ike uku ka ndi-ozi ji ab͕a àmà-ha bayere nbilite-n’ọnwu nke Onye-nwe-ayi Jisus: oké amara dikwasi-kwa-ra ha nile.

34 N’ihi na ọ dighi kwa onye ọ bula n’etiti ha nkpà nākpà: n’ihi na ka ha ra, bú ndi nwere ala ma-ọbu ulo, ha nēre ha, weta ọnu-ahia nile nke ihe nile erere,

35 tọb͕ọ ha n’ukwu ndi-ozi: ewe nēkè òkè enye ha nile n’otù n’otù, dika ọ di onye ọ bula nkpà.

36 Ma Josef, onye ndi-ozi kpọ-kwa-ra Banabas, (nke bu, ma asugharia ya, Nwa nke nkasi-obi), bú onye Livai, onye Saiprọs n’ọmumu-ya,

37 ebe o nwere ubi, o re ya, weta ego-ya, tọb͕ọ n’ukwu ndi-ozi.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 5

1 Ma otù nwoke nke anākpọ aha-ya Ananaias, ya na Safaira nwunye-ya, rere otù ihe o nwere,

2 we debere onwe-ya ufọdu nime ọnu-ahia-ya, nwunye-ya ma-kwa-ra, o we weta otù òkè, tọb͕ọ ya n’ukwu ndi-ozi.

3 Ma Pita siri, Ananaias, n’ìhi gini ka Setan mejuru obi-gi igwa Mọ Nsọ okwu-ugha, na idebere onwe-gi ufọdu nime ọnu-aha nke iberibe ala gi?

4 Mb͕e ọ nānọ, ọ̀ nọgideghi n’aka-gi? mb͕e eresiri ya, ọ̀ dighi kwa n’ike-gi? Gini mere i ji tiye ihe a n’obi-gi? Ọ bughi madu ka i gwara okwu-ugha, kama ọ bu Chineke.

5 Ma mb͕e Ananaias nuru okwu ndia ọ da n’ala, kubìe ume: ndi nile nke nuru ya we tua oké egwu.

6 Ndi bu umu-okorọbia nime ha we bilie, ke ya ákwà, ha we bupu ya lìe ya.

7 Ma ihe ra ka oge hour atọ gasiri, mb͕e nwunye-ya batara nime, nāmataghi ihe emereri.

8 Pita we za ya, si, Gwam, ọ̀ bu ihe ra otú a ka unu rere iberibe ala unu? Ọ si, E, ihe ra otú a.

9 Ma Pita siri ya, Gini mere unu nwere otù olu inwa Mọ nke Onye-nwe-ayi? le, ukwu nke ndi lìri di-gi di n’ọnu-uzọ, ha gēbupu kwa gi.

10 O we da n’ala ngwa ngwa n’ukwu-ya, kubìe ume: umu-okorọbia ahu we bata, hu ya ka ọ nwuru, ha we bupu ya, lìe ya n’akuku di-ya.

11 Nzukọ Kraist dum we tua oké egwu, ha na ndi nile ndi nuru ihe ndia.

12 Ma emere ọtutu ihe-iriba-ama na ọlu-ebube n’etiti ndi-Ju site n’aka ndi-ozi; ha nile were kwa otù obi nọ n’ìbà Solomon.

13 Ma nime ndi fọduru ọ dighi onye ọ bula nwere anya-ike iwere onwe-ya rapara ha n’aru: otú ọ di, ndi-Ju nēme ka ha di uku;

14 ewe tukwasi kari nye Onwe-nye-ayi ndi kwere na Ya, ìgwè madu ma ndkom ma ndinyom;

15 nke mere ka ha nēkupu ọbuná ndi aru nādighi ike, nēdebe ha n’amá, tọb͕ọ ha n’ihe-ndina na ute, ka, mb͕e Pita nāga, ka ọbuná nání onyinyo-ya we kpuchie otù onye nime ha.

16 Ọra madu nke obodo nile di Jerusalem buruburu we nāb͕akọ kwa, nēkuta ndi aru nādighi ike, na ndi ndi-mọ nādighi ọcha nēsob͕u: ewe me ka aru-ha nile n’otù n’otù di ike.

17 Ma onye-isi-nchu-àjà biliri, ya na ndi nile soro ya (nke bu irọ-òtù ndi-Sadusi), ha juputa-kwa-ra n’ekworo,

18 ha we tukwasi aka-ha n’aru ndi-ozi, tubà ha n’ulo-nkpọrọ ọra madu.

19 Ma mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi meghere ọnu-uzọ nile nke ulo-nkpọrọ ahu n’abali, we duputa ha, si,

20 Ganu, guzo, gwa kwa ndi-Ju n’ulo uku Chineke okwu nile nke Ndu a.

21 Ma mb͕e ha nuru nka, ha ba n’ulo uku Chineke mb͕e chi nābọ, we nēzí ihe. Ma onye-isi-nchu-àjà biara, ya na ndi soro ya, we kpọkọ nnọkọ-ikpé-ha, na nzukọ ndi-okenye umu Israel nile, we ziga n’ulo-nkpọrọ, ka ekuta ha.

22 Ma ndi nēje ozi ndi biara ahughi ha n’ulo-nkpọrọ; ha we laghachi, kọrọ ha,

23 si, Ayi huru ulo-nkpọrọ ka emechisiri ya ike nke-ọma, ayi hu-kwa-ra ndi-nche ka ha nēguzo n’ọnu-uzọ: ma mb͕e ayi meghere, ọ dighi onye ọ bula ayi huru nime ya.

24 Ma mb͕e ọchi-agha nke ulo Chineke na ndi-isi-nchu-àjà nuru okwu ndia, ha nwere obi abua nke-uku bayere ha ebe nka gērusi.

25 Ma otù onye biara kọrọ ha, si, Le, ndikom ahu unu tubàra n’ulo-nkpọrọ nọ n’ulo uku Chineke nēguzo nēzí kwa ndi-Ju ihe.

26 Mb͕e ahu ọchi-agha ahu na ndi nēje ozi jere, kuta ha, ma ha ejighi ihe-ike; n’ihi na ha nātu egwu ndi-Ju, ka aghara itu ha nkume.

27 Ma mb͕e ha kutasiri ha, ha guzoro ha n’etiti nnọkọ-ikpé.

28 si, Ayi nyesiri unu iwu ike ka unu ghara izí ihe n’aha nka: ma le, unu ewerewo ozizí-unu meju Jerusalem, unu nēzube kwa iweta ọbara Nwoke a tukwasi ayi n’isi.

29 Ma Pita na ndi-ozi zara, si, Ayi aghaghi ikweyere Chineke kari madu.

30 Chineke nke nna-ayi-hà mere ka Jisus si n’ọnwu bilie, Onye unu onwe-unu b͕uru, nākwuba Ya n’elu osisi.

31 Onye ahu ka Chineke were aka-nri-Ya welie elu ibu Onye-ndú na Onye-nzọputa, inye Israel nchèghari na nb͕aghara nmehie.

32 Ayi onwe-ayi bu kwa ndi-àmà nke ihe ndia; Mọ Nsọ bu kwa onye-àmà, Onye Chineke nyere ndi nēkweyere Ya.

33 Ma mb͕e ha nuru nka, amapue ha n’obi-ha, ha we zube ib͕u ha.

34 Ma otù onye biliri na nnọkọ-ikpé ahu, bú onye-Farisi, aha-ya bu Gameliel, onye nēzí iwu Moses, onye ndi-Ju nile nāsọpuru, o we kwue ka akpọpu madu ahu n’èzí nwa oge.

35 O we si ha, Ndikom nke Israel, nēzenu onwe-unu n’ihe banyere madu ndi a, ihe unu gaje ime.

36 N’ihi na mb͕e ubọchi nda akērughi Teudas biliri, nākpọ onwe-ya ihe; onye ọnu-ọgugu ndikom, ra ka nnù madu, dayere ya: onye eb͕uru; ndi nile, ka ha ra, bú ndi kweyere ya, we b͕asa, ha we ghọ ihe-efu.

37 Mb͕e onye ahu gasiri Judas onye Galili biliri n’ubọchi odide-aha, me kwa ka ufọdu n’etiti ndi-Ju so ya n’azu: onye ahu la-kwa-ra n’iyì; ewe chusa ndi nile, ka ha ra, bú ndi kweyere ya.

38 M’si kwa unu ub͕u a, Wepunu aka n’aru madu ndia, rapu-kwa-nu ha: n’ihi na ọ buru na ìzù a ma-ọbu ọlu a sitere n’aka madu agākwatu ya n’ala:

39 ma ọ buru na o sitere n’aka Chineke, unu agaghi-apu ikwatu ha n’ala; ka aghara ihu unu dika ndi nālu kwa ọ̀gù megide Chineke ma eleghi anya.

40 Ha we kweyere ya: mb͕e ha kpọsiri ndi-ozi biakute ha, ha pia ha ihe, nye ha iwu ka ha ghara ikwu okwu n’aha Jisus, ha we rapu ha ka ha la.

41 Ya mere ha siri n’iru nnọkọ-ikpé ahu la, nāṅuri na aguru ha na ndi kwesiri ka eme ha ihe-ihere n’ihi Aha ahu.

42 Ma kwa-ubọchi, n’ulo uku Chineke na n’ulo nke aka ha, ha adighi-arapu izí ihe na izisa ozi ọma Jisus, na Ọ bu Kraist.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 6

1 Ma na mb͕e ahu, mb͕e ndi nēso uzọ Jisus nāba uba, ndi-Ju nāsu asusu Grik malitere itamu megide ndi-Hibru, n’ihi na elefuru ndinyom-ha ndi di-ha nwuru anya n’ije-ozi, bú ikère ndi Kraist òkè, kwa-ubọchi.

2 Ndi-ozi iri na abua ahu we kpọ ọra ndi nēso uzọ Jisus biakute ha, si, Ọ dighi utọ ka ayi rapu okwu Chineke, jere table ozi.

3 Kama, umu-nna-ayi, chọputanu n’etiti unu ndikom asa ndi ab͕ara ha ezi àmà, ndi juputara na Mọ Nsọ na amam-ihe, ndi ayi gēme ndi-isi n’ọlu a di nkpà.

4 Ma ayi onwe-ayi gānọgidesi ike n’ekpere-ayi, na n’ije ozi okwu Chineke.

5 Okwu ahu we tọ ọra ha nile utọ: ha we rọputa Stifen, bú nwoke nke juputara n’okwukwe na Mọ Nsọ, ya na Filip, na Prọkọrọs, na Naikanoa, na Taimon, na Pamenas, na Nikọlas, bú onye Antiọk nke nēso uzọ ndi-Ju:

6 ndi ha guzoro n’iru ndi-ozi: mb͕e ha kpesiri ekpere, ha we bikwasi ha aka n’isi.

7 Okwu Chineke we nāga n’iru; ọnu-ọgugu nke ndi nēso uzọ Jisus nāba kwa uba na Jerusalem ri nne; oké ìgwè ndi-nchu-àjà nāṅa kwa okwukwe ahu nti.

8 Ma Stifen, ebe o juputara n’amara na ike, ọ nālu oké ọlu-ebube na ihe-iriba-ama di iche iche n’etiti ndi-Ju.

9 Ma ufọdu biliri n’etiti ndi sitere n’ulo-nzukọ nke anākpọ ulo-nzukọ nke ndi-Libatin, na nke ndi Sairini, na nke ndi Aleksandria, na nke ndi sitere na Silisia na Esia, ha na Stifen nājurita onwe-ha ajuju.

10 Ha enweghi kwa ike iguzogide amam-ihe na Mọ Nsọ o ji ekwu okwu.

11 Mb͕e ahu ha jiri aghughọ we rọputa ndikom, ndi siri, Ayi anuwo ya ka o nēkwu okwu nēkwulu Moses na Chineke.

12 Ha we kpalie ndi-Ju, na ndi-okenye, na ndi-ode-akwukwọ, we biakwasi ya, jide ya, kubata ya na nnọkọ-ikpé,

13 we guzo ndi-àmà ugha, ndi si, Nwoke a arapughi ikwu okwu megide ebe nsọ a, na iwu-ayi:

14 n’ihi na ayi anuwo ya ka ọ nāsi, na Jisus nka, bú Onye Nazaret, gākwatu ebe a, nwo kwa ọme-n’ala nile nke Moses rara nye ayi n’aka.

15 Ndi nile ndi nọduru na nnọkọ-ikpé ahu, mb͕e ha legidere ya anya, ha we hu iru-ya dika ọ bu iru mọ-ozi.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 7

1 Onye-isi-nchu-àjà we si, Ìhe ndia di otú a?

2 O we si,

Umu-nnam na ndi bu nnam, nurunu. Chineke nke ebube mere ka nna-ayi Abraham hu Ya anya, mb͕e ọ nọ na Mesọpọtemia, mb͕e ọ kēbighi na Heran,

3 O we si ya, Si n’ala-gi na n’etiti ikwu-gi pua, bia n’ala ahu nke M’gēgosi gi.

4 Mb͕e ahu o siri n’ala ndi Kaldea puta, we biri na Heran: mb͕e nna-ya nwuru, Chineke we me ka o site n’ebe ahu bia biri n’ala nka, nke unu onwe-unu bi nime ya ub͕u a:

5 ma O nyeghi ya ala-nketa nime ya, é-è, Ọ nyeghi ya ebe izọkwasi ukwu-ya: O we kwe nkwa na O gēwere ya nye ya, na nkpuru-ya soro ya n’azu, ka ọ buru ihe ha nwere, mb͕e ọ kādighi nwa ọ muru.

6 Ma Chineke kwuru okwu otú a, na nkpuru-ya gānọ dika ndi-ọbìa n’ala nābughi nke aka ha, na ndi ala ahu gēme kwa ha ka ha buru ndi-orù, me kwa ha ihe ọjọ, nnù arọ.

7 Mba ahu nke ha gābu orù-ha ka Mu onwem gēkpe kwa ikpé, ka Chineke kwuru: mb͕e ihe ndia gasiri ha gāputa kwa, kpe-kwa-ram n’ebe a.

8 O we nye ya ọb͕ub͕a-ndu nke obibì-úgwù: otú a Abraham we mua Aisak, we bì ya úgwù n’ubọchi nke-asatọ; Aisak we mua Jekob, Jekob we mua nna uku ayi iri na abua.

9 Nna uku ahu, ebe ha nēkwo Josef ekworo, ha we re ya ga n’Ijipt: ma Chineke nọyere ya,

10 weputa kwa ya na nkpab͕u-ya nile, nye kwa ya amara na amam-ihe n’iru Fero eze Ijipt; o we me ya onye-isi Ijipt na ulo-ya dum.

11 Oké unwu we dikwasi Ijipt na Kenean dum, ya na oké nkpab͕u: nna-ayi-hà ahughi ihe gēju ha afọ.

12 Ma mb͕e Jekob nuru na ọka di n’Ijipt, o we zipu nna-ayi-hà na mbu.

13 Na nke mere ya ub͕ò abua ewe me ka umu-nne Josef mara Josef; ewe me ka ndi-aru Josef puta ìhè nye Fero.

14 Josef we ziga, kpọ Jekob, bú nna-ya, na ikwu-ya nile, ka ha biakute ya, ọgu madu atọ na iri na ise.

15 Jekob we ridata n’Ijipt; o we nwua, ya onwe-ya, na nna-ayi-hà;

16 ewe būru ha gabiga n’ofè rue Shekem, tọb͕ọ ha n’ílì ahu nke Abraham were ọnu-ahia n’ọla-ọcha go n’aka umu Hemoa nime Shekem.

17 Ma mb͕e oge nkwa ahu nēru nso, nke Chineke kwere Abraham, ndi-Ju gara n’iru ba kwa uba n’Ijipt,

18 rue mb͕e eze di iche biliri ibu eze Ijipt, onye nāmataghi Josef.

19 Onye ahu were aghughọ meso ndi-aru-ayi, me kwa nna-ayi-hà ihe ọjọ, ka ha we tufue umu ọhu ha ka aghara ime ka ha di ndu.

20 N’oge ahu ka amuru Moses, o we ma nma nke-uku; ewe zùa ya ọnwa atọ n’ulo-ya:

21 ma mb͕e etufuru ya, nwa-nwanyi Fero paliri ya, zùa ya ka ọ buru nwa ya onwe-ya nwere.

22 Ewe zí Moses ihe n’amam-ihe nile nke ndi Ijipt; o we di ike n’okwu-ya na ọlu-ya nile.

23 Ma mb͕e o rubere ọgu arọ abua, ileta umu-nne-ya, bú umu Israel, batara n’obi-ya.

24 Ma mb͕e ọ huru otù onye nime ha ka anēmejọ, ọ lubara ya ọ̀gù, we kpeputa onye anēmub͕u, ebe o tib͕uru onye Ijipt:

25 ma o chère na umu-nne-ya ghọtara na Chineke nēsi n’aka-ya enye ha nzọputa; ma ha aghọtaghi.

26 N’ubọchi soni o we me ka ha hu ya anya mb͕e ha nālu ọ̀gù, o we mebe ka ha dirita n’udo, si, Ndikom, unu bu umu-nne; gini mere unu nēmejọrita onwe-unu?

27 Ma onye nēmejọ ibe-ya nupuru ya, si, Ònye mere gi ka i buru onye-isi na onye-ikpé n’ebe ayi nọ?

28 Ọ̀ bu ib͕um ka gi onwe-gi nāchọ, dika i b͕uru onye Ijipt nyahuru?

29 Moses we b͕alaga n’okwu a, we nọ dika ọbìa n’ala Midian, ebe ọ muru umu-ndikom abua.

30 Mb͕e ọgu arọ abua zuru, ewe me ka ọ hu mọ-ozi n’ọhia nke ugwu Sainai, n’ire ọku nime osisi ntà.

31 Ma mb͕e Moses huru ya, ihe ọ huru juru ya anya: ma mb͕e ọ nābiaru nso ikiri ya, olu nke Onye-nwe-ayi dara,

32 si, Mu onwem bu Chineke nke nna-gi-hà, Chineke nke Abraham, na nke Aisak, na nke Jekob. Aru we ma Moses jijiji, o nweghi kwa anya-ike ikiri.

33 Onye-nwe-ayi we si ya, Tọpu akpukpọ-ukwu n’ukwu-gi abua: n’ihi na ebe i nēguzo bu ala nsọ.

34 N’ezie ahuwom ihe ọjọ anēme ndim nke di n’Ijipt, anuwokwam isu-udè-ha, M’we ridata iweputa ha: ub͕u a bia kwa, M’gēziga gi n’Ijipt.

35 Moses nka, onye ha juru aju, si, Onye mere gi ka i buru onye-isi na ikpé? onye a ka Chineke ziteworo ibu onye-isi, ibu kwa onye-nb͕aputa, ya na aka mọ-ozi ahu nke emere ka ọ hu ya n’osisi ntà ahu.

36 Nwoke a duputara ha, mb͕e ọ lusiri ọlu-ebube di iche iche na ihe-iriba-ama di iche iche n’Ijipt, na nime Oké Osimiri Uhie, na nime ọhia ọgu arọ abua.

37 Onye a bu Moses ahu, onye siri umu Israel, Chineke gēme ka Onye-amuma, Nke di ka mu onwem, biliere unu site n’etiti umu-nne-unu.

38 Nwoke a bu onye nānọri nime nzukọ n’ọhia, ya na mọ-ozi ahu nke gwara ya okwu n’ugwu Sainai, na nna-ayi-hà: onye nara okwu di ndu nke si n’ọnu Chineke puta inye ayi:

39 onye nna-ayi-hà nāchọghi iṅa nti, kama ha nupuru ya n’ebe ha nọ, we laghachi azu n’Ijipt n’obi-ha,

40 nāsi Eron, Mere ayi chi ndi ganēje n’iru ayi: n’ihi na Moses a, onye duputara ayi n’ala Ijipt, ayi amataghi ihe mere ya.

41 Ha we kpua nwa-ehi n’ubọchi ahu, we butere arusi ahu ihe àjà, we ṅuria n’ọlu aka-ha.

42 Ma Chineke chighariri, we rara ha nye ikpere usu ihe di n’elu-igwe; dika edeworo ya n’akwukwọ ndi-amuma, si,

Ọ̀ di anu eb͕uru eb͕u na àjà unu wetaram

Ọ̀gu arọ abua n’ọhia, unu ulo Israel?

43 Unu we palie ulo-ikwū nke Mọlọk,

Na kpakpando nke chi ahu, bú Refan,

Ihe-atù unu mere ikpọ isi ala nye ha:

M’gēme kwa ka unu je biri n’ofè Babilon.

44 Nna-ayi-hà nwere ulo-ikwū nke àmà n’ọhia, dika Ọ kara àkà, bú Onye gwara Moses, ka o me ya ka ọ di ka ihe-atù nke ọ hururi.

45 Nke, mb͕e o ruru ha aka, nna-ayi-hà na Joshua bubatara, mb͕e ha natara ala nke mba nile ahu, ndi Chineke nupuru n’iru nna-ayi-hà, rue ubọchi Devid;

46 onye huru amara n’iru Chineke, we riọ ichọtara Chineke nke Jekob ebe-obibi.

47 Ma Solomon wuru Ya ulo.

48 Otú ọ di, Onye kachasi ihe nile elu adighi-ebi n’ulo eji aka wu; dika onye-amuma siri,

49 Elu-igwe bu oche-ezem,

Uwa bu kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwum abua:

Àha ulo gini ka unu gēwurum? ka Onye-nwe-ayi kwuru:

Ma-ọbu gini bu ebe izu-ikem?

50 Ọ̀ bughi akam mere ihe ndia nile?

51 Ndi kwesiri olu ike na ndi anēbighi úgwù n’obi na nti, unu onwe-unu nālu ọ̀gù megide Mọ Nsọ mb͕e nile: dika nna-unu-hà mere, otú ahu ka unu onwe-unu nēme.

52 Onye nime ndi-amuma ka nna-unu-hà nēsob͕ughi? ha we b͕ue ndi buru uzọ kwusa okwu bayere ọbibia nke Onye ezi omume ahu; Onye unu onwe-unu ghọrọ ub͕u a ndi rara Ya nye na ndi b͕uru Ya:

53 unu ndi natara iwu ahu dika enyere ya site n’aka ndi-mọ-ozi, ma unu edebeghi ya.

54 Ma mb͕e ha nuru ihe ndia, ewe mapue ha n’obi-ha, ha we takwasi ya ikekere ezé-ha.

55 Ma, ebe o juputara na Mọ Nsọ, ọ legide anya n’elu-igwe, we hu ebube Chineke, na Jisus ka Ọ nēguzo n’aka-nri Chineke,

56 o we si, Le, anamahu elu-igwe ka emegheworo ha, na Nwa nke madu ka Ọ nēguzo n’aka-nri Chineke.

57 Ma ha were oké olu ti nkpu, kpuchi kwa aka na nti-ha, were otù obi nukwasi ya;

58 ha we tupu ya n’obodo, tu kwa ya nkume: ndi-àmà we wusa uwe-ha n’ukwu otù nwa-okorọbia anākpọ Sọl.

59 Ha we tua Stifen nkume, ka ọ nākpọku Onye-nwe-ayi, nāsi, Onye-nwe-ayi Jisus, nara mọm nke-ọma.

60 O we b͕u ikperè n’ala, were kwa oké olu ti nkpu, si, Onye-nwe-ayi, atukwasila nmehie a n’isi-ha. Mb͕e o kwusiri okwu a, o we da n’ura.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 8

1 Ma ob͕ub͕u-ya di Sọl ezi nma.

Oké nsob͕u we puta n’ubọchi ahu megide nzukọ Kraist di na Jerusalem; ha nile we b͕asasia n’ala Judia na Sameria dum, ma-ọbughi ndi-ozi.

2 Ndikom ufọdu ndi nātu egwu Chineke we lìe Stifen, kwa-kwa-ra ya oké ákwá.

3 Ma Sọl nēsob͕u nzukọ Kraist nke-uku, nābà n’ulo nile n’otù n’otù, ọ nādọkpu kwa ndikom na ndinyom we rara ha nye ka atubà ha n’ulo-nkpọrọ.

4 Ya mere ndi b͕asara jeghariri nēzisa ozi ọma, bú okwu Chineke.

5 Filip we rida n’obodo Sameria, kwusara ha Kraist-ayi.

6 Ìgwè madu nile we were otù obi nāṅa nti ihe nile Filip nēkwu, mb͕e ha nuru, hu kwa ihe-iriba-ama ọ nēme.

7 N’ihi na site n’aru ọtutu ndi nwere ndi-mọ nādighi ọcha ka mọ ahu putara, nēwere oké olu ti nkpu: eme-kwa-ra ka aru ọtutu madu di ike, bú ndi akuku-aru-ha nwuru anwu, na ndi dara ngwurọ.

8 Oké ọṅù we di n’obodo ahu.

9 Ma otù nwoke di, Saimon bu aha-ya, onye n’oge gara aga nēme mb͕asi n’obodo ahu, nēme kwa ka ibobo nwua mba Sameria n’aru, nāsi na ya onwe-ya bu onye uku:

10 onye ha nile, site n’onye ntà rue onye uku nāṅa nti, si, Onye a bu ike ahu nke Chineke nke anākpọ Ike Uku.

11 Ha we nāṅa ya nti, n’ihi na o wereri mb͕asi-ya nile me ka ibobo nwua ha n’aru n’oge di anya.

12 Ma mb͕e ha kwere Filip ka o nēzisa ozi ọma bayere ala-eze Chineke na aha Jisus Kraist, ewe me ha baptism, ma ndikom ma ndinyom.

13 Saimon onwe-ya we kwere kwa: mb͕e emesiri ya baptism, o we nọgidesi ike n’ebe Filip nọ; mb͕e ọ nāhu na anēme ihe-iriba-ama na oké ọlu di ike di iche iche, ibobo we nwua ya n’aru.

14 Ma mb͕e ndi-ozi ndi nọ na Jerusalem nuru na Sameria anarawori okwu Chineke nke-ọma, ha zigara ha Pita na Jọn:

15 ndi, mb͕e ha ridatara, ha kpere ekpere bayere ha, ka ha we nara Mọ Nsọ:

16 n’ihi na ọ kādakwasighi n’isi onye ọ bula n’etiti ha: ọ bu nání na emere ha-ri baptism ibà n’aha Onye-nwe-ayi Jisus.

17 Mb͕e ahu ha bikwasiri ha aka-ha n’isi, ha we nara Mọ Nsọ.

18 Ma mb͕e Saimon huru na anēnye Mọ Nsọ site n’ibikwasi aka nke ndi-ozi, o chere ego n’iru ha,

19 si, Nye-kwa-num ike a, ka, onye ọ bula m’gēbikwasi akam abua n’isi, ka o we nara Mọ Nsọ.

20 Ma Pita siri ya, Ka ọla-ọcha-gi so gi la n’iyì, n’ihi na i chère na i gānata onyinye Chineke site n’ego.

21 I nweghi òkè ma-ọbu ihe-nketa n’okwu a: n’ihi na obi-gi ezighi ezi n’iru Chineke.

22 Ya mere chègharia n’obi ọjọ gi a, riọ Onye-nwe-ayi, ma eleghi anya agāb͕aghara gi èchìchè obi-gi.

23 N’ihi na ahurum na i nọ n’òlùlù ilu na ab͕u nke ajọ omume.

24 Saimon we za, si, Unu onwe-unu riọrọm Onye-nwe-ayi, ka ihe ọ bula nime ihe unu kwuworo ghara ibiakwasim.

25 Ya mere, mb͕e ha dusiri ọdu kwu kwa okwu Onye-nwe-ayi, ha laghachiri na Jerusalem, nēzisa kwa ozi ọma nye ọtutu obodo ntà ndi Sameria.

26 Ma mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi gwara Filip okwu, si, Bilie, nāga n’akuku Ndida rue uzọ nke si na Jerusalem arida rue na Geza: uzọ ahu bu ọhia.

27 O we bilie ga: ma le, otù nwoke nke Etiopia, bú onozi nke di ike nke-uku n’okpuru Kandesi, eze-nwanyi ndi Etiopia, onye emere onye-isi àkù-ya nile, onye biarari na Jerusalem ikpọ isi ala nye Chineke;

28 o we nālaghachi, nānọdu kwa n’ub͕ọ-ya, nāgu kwa akwukwọ Aisaia onye-amuma.

29 Mọ Nsọ we si Filip, Jekuru ub͕ọ-ala ahu, nọnyaba kwa ya nso.

30 Filip we b͕akuru ya, we nu ya ka ọ nāgu akwukwọ Aisaia onye-amuma, o we si, Ì nāmata ihe i nāgu?

31 Ọ si, É-è, n’ihi na #m’gēsi aṅa pu imata, ma ọ buru na ọ dighi onye gēdum? O we riọ Filip ka ọ rigota, ka ya na ya nọdu.

32 Ma ibe ihe edeworo n’akwukwọ nsọ nke ọ nāgu bu nka,

Esekpuru Ya, dika aturu, je ob͕ub͕u;

Dika nwa-aturu da-kwa-ra ob͕i n’iru onye nākpacha ya aji,

Otú a ka Ọ nādighi-asaghe ọnu-Ya:

33 Ewepuru ikpé-Ya nime ọnọdu-Ya di ala:

Ònye gākọ ọb͕ọ Ya?

N’ihi na anēwepu ndu-Ya n’uwa.

34 Onozi ahu we za Filip, si, Ariọm i, ònye ka onye-amuma nka nēkwu okwu a bayere? ọ̀ bu ya onwe-ya ma-ọbu onye ọzọ di iche?

35 Filip we saghe ọnu-ya, zì ya ozi ọma Jisus, nāmalite site n’ihe a edeworo n’akwukwọ nsọ.

36 Ma mb͕e ha nāga n’uzọ, ha biaruru otù miri; onozi ahu we si, Le, miri; gini nānapu imem baptism?

37 Filip we si ya, Ọ buru na i ji obi-gi dum we kwere, agēme gi. O we za, si, Ekwerem na Jisus Kraist bu Ọkpara Chineke.

38 O we kwue ka ub͕ọ-ala-ya guzo: ha abua we rida na miri, ma Filip ma onozi ahu; o we me ya baptism.

39 Ma mb͕e ha siri na miri rigota, Mọ nke Onye-nwe-ayi wepuru Filip; onozi ahu ahughi kwa ya ọzọ, n’ihi na ọ nāga n’uzọ-ya nāṅuri ọṅu.

40 Ma ahuru Filip n’Azotọs: mb͕e ọ nāgabiga ọ nēzisa kwa ozi ọma gwa ndi obodo ahu nile, rue mb͕e ọ biaruru Sisaria.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 9

1 Ma Sọl, ebe ọ nēwere iba-nba na ob͕ub͕u ku ume megide ndi nēso uzọ Onye-nwe-ayi rue ub͕u a, o jekuru onye-isi-nchu-àjà,

2 riọ akwukwọ-ozi n’aka-ya igaru Damaskọs inye ndi ulo-nzukọ, ka ọ gābu, ma asi na ọ chọtara ndi ọ bula di n’Uzọ a, ma-ọbu ndikom ma-ọbu ndinyom, ka o we dọkpuru ha n’ab͕u bia Jerusalem.

3 Ma mb͕e ọ nāga, o rue na ọ nābiaru Damaskọs nso: na mberede ìhè si n’elu-igwe b͕uru ya àmùmà buruburu:

4 o we da n’ala, nu otù olu ka ọ nāsi ya, Sọl, Sọl, gini mere i nēsob͕um?

5 O we si, Ì bu Onye, Onye-nwe-ayi? Ọ si Mu onwem bu Jisus, Onye gi onwe-gi nēsob͕u:

6 ma bilie, ba nime obodo, agāgwa gi ihe i nāghaghi ime.

7 Ndikom ndi soro ya n’ije we guzo apughi ikwu okwu, ebe ha nānu olu ahu, ma ha ahughi onye ọ bula.

8 Sọl we si n’ala bilie; ma mb͕e anya-ya saghere, ọ hughi ihe ọ bula; ha we jide ya n’aka duru ya, we dubata ya na Damaskọs.

9 Ọ hughi kwa uzọ ubọchi atọ, ọ dighi kwa ihe ọ nēri ma-ọbu nke ọ nāṅu.

10 Ma otù onye nke nēso uzọ Jisus nọ na Damaskọs, aha-ya bu Ananaias; Onye-nwe-ayi we si ya n’ọhù, Ananaias. O we si, Le, mu onwem, Onye-nwe-ayi.

11 Onye-nwe-ayi we si ya, Bilie, ga rue amá nke anākpọ Amá Eguzoziri, chọ kwa n’ulo Judas otù onye aha-ya bu Sọl, onye Tasọs: n’ihi na le, ọ nēkpe ekpere;

12 ọ hu-kwa-ra otù nwoke, aha-ya bu Ananaias, ka ọ nābata, nēbikwasi kwa ya aka-ya abua n’isi, ka ewe me ka ọ hu uzọ.

13 Ma Ananaias zara, si, Onye-nwe-ayi, anurum n’ọnu ọtutu madu ihe bayere nwoke a, ka ha ra, bú ajọ ihe o mere ndi nsọ Gi na Jerusalem:

14 n’ebe a ka o nwe-kwa-ra ike site n’ebe ndi-isi-nchu-àjà nọ ike ndi nile nākpọku aha-Gi ab͕u.

15 Ma Onye-nwe-ayi siri ya, Ga: n’ihi na onye ahu bu ihe-ọlu arọputara nyem, ka o buru aham che n’iru mba ọzọ na ndi-eze, na umu Israel:

16 n’ihi na Mu onwem gēgosi ya ka ha ra, bú ahuhu nile ọ nāghaghi ihu n’ihi aham.

17 Ananaias we je, ba n’ulo ahu; o we bikwasi ya aka-ya abua n’isi, si, Sọl, nwa-nnam, Onye-nwe-ayi, bú Jisus, Onye mere ka i hu Ya n’uzọ i si bia, ezitewom, ka ewe me ka i hu uzọ, ka i we juputa kwa na Mọ Nsọ.

18 Ngwa ngwa ihe dika akpirikpa we si n’anya-ya dapu, eme-kwa-ra ka ọ hu uzọ; o we bilie, eme ya baptism;

19 o we nara nri, ewe me ka ọ nwe ume.

Ya na ndi nēso uzọ Jisus na Damaskọs we nọ ubọchi ufọdu.

20 Ngwa ngwa n’ulo-nzukọ-ha nile o we nēkwusa Jisus, na Ya onwe-ya bu Ọkpara Chineke.

21 Ibobo we nwua ndi nile nuru ya n’aru, ha nāsi, Ọ̀ bughi onye a bu onye mebiri nime Jerusalem ndi nākpọku aha nka? ọ bia-kwa-rari n’ebe a ime ihe a, bú, ka o we dọkpuru ha n’ab͕u je n’iru ndi-isi-nchu-àjà.

22 Ma emere Sọl ka o nwe kari ike, ọ nēkwu kwa okwu nke b͕ara ndi-Ju bi na Damaskọs ghari, ebe ọ nēgosi nke-ọma na Onye a bu Kraist-ha.

23 Ma mb͕e ọtutu ubọchi zuru, ndi-Ju b͕ara ìzù ib͕u ya:

24 ma emere ka Sọl mara ajọ ìzù-ha. Ha we nēche kwa ọnu-uzọ-ama nile ehihie na abali ka ha we b͕ue ya:

25 ma ndi nēso uzọ-ya kuru ya n’abali, weda ya n’ala site na mb͕idi nke obodo, nārada ya n’abọ.

26 Ma mb͕e ọ biaruru Jerusalem, ọ nwara iwere onwe-ya rapara n’aru ndi nēso uzọ Jisus: ma ha nile nātu egwu ya, ebe ha nēkweghi na ọ bu onye nēso uzọ Jisus.

27 Ma Banabas jidere ya n’aka, we duru ya jekuru ndi-ozi, kọrọ ha otú ọ hururi Onye-nwe-ayi n’uzọ, kọkwa-ra ha, si, na Ọ gwara ya-ri okwu, ya na otú o kwuwarari okwu na Damaskọs n’aha Jisus.

28 Ya na ha we nọ, ọ nābata nāpu kwa na Jerusalem,

29 nēkwuwa okwu n’aha Onye-nwe-ayi: o we nāgwa ndi-Ju nāsu asusu Grik okwu, ya na ha nājurita kwa onwe-ha ajuju; ma ha tiyere aka-ha ib͕u ya.

30 Ma mb͕e umu-nna nime Kraist mazuru ya, ha dudara ya rue Sisaria, we zipu ya igaru Tasọs.

31 Ya mere nzukọ Kraist nime Judia na Galili na Sameria dum nwere udo, ebe anēwuli ya elu dika ulo; ọ nāba kwa uba, ebe ọ nāga n’egwu Onye-nwe-ayi na nkasi-obi nke Mọ Nsọ.

32 O rue, mb͕e Pita nējezu n’ebe nile, ọ ridakuru kwa ndi nsọ ndi bi na Lida.

33 O we hu n’ebe ahu otù nwoke, aha-ya bu Ineas, onye tọb͕ọrọ arọ asatọ n’ute-ya; n’ihi na akuku-aru-ya nwuru anwu.

34 Pita we si ya, Ineas, Jisus Kraist nēme gi ka aru di gi ike: bilie, dozi kwa ute nke gi. Ngwa ngwa o we bilie.

35 Ndi nile bi na Lida na Sheron we hu ya, ndi ahu we chigharikute Onye-nwe-ayi.

36 Ma otù nwanyi nke nēso uzọ Jisus nọ na Jọpa, aha-ya bu Tabita, nke anākpọ Dọkas, ma asugharia ya: nwanyi a juputara n’ezi ọlu na ọlu ebere nke ọ nēme.

37 Ma o ruru n’ubọchi ahu, na aru-ya adighi ike, o we nwua: mb͕e ha sasiri ya aru, ha tọbọ ya n’ime-ulo di n’elu ulo.

38 Ma ebe Lida di Jọpa nso, ndi nēso uzọ Jisus, ebe ha nuru na Pita nọ n’ebe ahu, ha zigara ya ndikom abua, nāriọ ya, si, Alala azu ibiakute ayi.

39 Pita we bilie so ha je. Ma mb͕e ọ biaruru, ha duru ya rigo n’ime-ulo ahu di n’elu ulo: ndinyom nile ndi di-ha nwuru guzo-kwa-ra ya nso nākwa ákwá, nēgosi kwa uwe-ime na uwe ọzọ, ka ha ra, bú nke Dọkas nēme mb͕e ya na ha nọ.

40 Ma Pita chupuru ha nile n’èzí, we b͕ue ikperè n’ala, kpe ekpere; o we chigharia n’ebe ozu ahu di, si, Tabita, bilie. Nwanyi ahu we saghe anya-ya; mb͕e ọ huru Pita, o we nọlie.

41 O we nye ya aka-ya, palie ya elu; mb͕e ọ kpọsiri ndi nsọ na ndinyom ndi di-ha nwuru, ọ che ya na ndu n’iru ha.

42 Ewe mara ya na Jọpa dum: ọtutu madu we kwere n’Onye-nwe-ayi.

43 O we rue, na ọ nọgidere ọtutu ubọchi na Jọpa n’ulo otù onye, bú Saimon, onye nēdozi akpukpọ anu.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 10

1 Ma otù nwoke nọ na Sisaria, aha-ya bu Kọniliọs, ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise nke òtù ndi-agha ahu anākpọ òtù Itali,

2 onye nāsọpuru Chineke, onye ya na èzí-na-ulo-ya nile nātu kwa egwu Chineke, onye nālu ọtutu ọlu ebere nye ndi-Ju, nēkpe-kwa-ra Chineke ekpere mb͕e nile.

3 Ọ huwara n’ọhù, n’ihe ra ka oge hour nke-iteghete n’ehihie, mọ-ozi nke Chineke, ka ọ nābiakute ya, nāsi kwa ya, Kọniliọs.

4 O we legide ya anya, tu kwa egwu, si, Ọ̀ bu gini, Onye-nwe-ayi? Ọ si ya, Ekpere-gi nile na ọlu ebere gi nile rigoro ibu ihe-ncheta n’iru Chineke.

5 Ub͕u a ziga kwa ndikom na Jọpa, kpọta otù onye, bú Saimon, onye anākpọ kwa Pita:

6 onye ahu nānọ dika ọbìa n’ulo otù onye, bú Saimon, onye nēdozi akpukpọ anu, onye ulo-ya di n’usọ oké osimiri.

7 Ma mb͕e mọ-ozi ahu nke gwara ya okwu lasiri, ọ kpọ madu abua nime ndi nējere ya ozi, na otù onye-agha nke nāsọpuru Chineke nime ndi nānọgide ya nso mb͕e nile;

8 mb͕e ọ kọsiri ha ihe nile, o we ziga ha na Jọpa.

9 Ma n’echi-ya, mb͕e ndi ahu nọ n’ije-ha, nābiaru kwa obodo ahu nso, Pita rigoro n’elu ulo ikpe ekpere, n’ihe ra ka oge hour nke-isi:

10 agu we gua ya, o we chọ idetu ihe ọnu: ma mb͕e ha nēdozi ihe, ihe di ka inyoghi biara ya n’anya;

11 o we hu elu-igwe ka emeghere ya-ri, ya na otù ihe ka ọ nārida, dika oké ákwà ọcha, anēsi na nkuku anọ eweda ya n’ala:

12 nke anu ukwu anọ na ihe nākpu akpu nke ala na anu-ufe nke elu-igwe nile di iche iche di nime ya.

13 Otù olu we bia rue ya nti, si, Pita, bilie; b͕ue, ri kwa.

14 Ma Pita siri, M’gaghi-eri ma-ọli, Onye-nwe-ayi; n’ihi na ọ dighi mb͕e ọ bula m’riri ihe ọ bula nke ruru árú nke nādighi kwa ọcha.

15 Otù olu we bia rue ya nti ọzọ nke ub͕ò abua, si, Ihe Chineke mere ka ha di ọcha, gi onwe-gi emela ha ihe ruru árú.

16 Ewe me ihe a ub͕ò atọ: ngwa ngwa ewe nara ákwà ahu rigo n’elu-igwe.

17 Ma mb͕e Pita nēnwe obi abua nime onwe-ya ihe ọ gābu, bú ọhù ọ hururi, le, ndikom ahu ndi Kọniliọs zitereri, ebe ha jusiri ajuju ulo Saimon, ha guzoro n’ọnu-uzọ-ama,

18 we kpọ jua ma Saimon, onye anākpọ kwa Pita, nānọ dika ọbìa n’ebe ahu.

19 Ma mb͕e ọhù ahu nādi n’obi Pita, Mọ Nsọ siri ya, Le, ndikom atọ nāchọ gi.

20 Ma bilie, rida, so ha ga, enweghi uche abua: n’ihi na Mu onwem ezitewo ha.

21 Pita we ridakuru ndikom ahu, si, Le, mu onwem bu onye unu nāchọ: gini bu ihe unu biaworo n’ihi ya?

22 Ha we si, Kọniliọs ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, nwoke bu onye ezi omume nke nātu kwa egwu Chineke, onye mba ndi-Ju dum nāb͕a-kwa-ra ya ezi àmà, ya ka mọ-ozi nke di nsọ duru ọdú site na Chineke, ikpọta gi n’ulo-ya, na inu okwu ufọdu si gi n’ọnu puta.

23 Ya mere ọ kpọbatara ha, le ha ọbìa.

Ma n’echi-ya o bilie so ha pua, ufọdu nime umu-nna nime Kraist, bú ndi Jọpa, so-kwa-ra ya je.

24 N’echi-ya ha ba nime Sisaria. Ma Kọniliọs nēle anya ha, ọ kpọkọ-kwa-rari ndi-ikwu-ya na ndi-eyì-ya ọ huru n’anya.

25 Ma mb͕e o ruru na Pita batara, Kọniliọs zutere ya, da n’ala n’ukwu-ya, kpọ isi ala nye ya.

26 Ma Pita weliri ya elu, si, Bilie; mu onwem bu kwa madu.

27 Ka ya na ya nākparita uka, ọ ba nime, hu ọtutu madu ndi b͕akọrọri:

28 o we si ha, Unu onwe-unu mara otú ọ bu ihe nēzighi ezi n’iwu ka nwoke nke bu onye-Ju were onwe-ya rapara n’aru onye mba ọzọ ma-ọbu ijekuru ya; otú ọ di, mu onwem ka Chineke gosiri ka m’ghara ikpọ madu ọ bula ihe ruru árú ma-ọbu ihe nādighi ọcha:

29 n’ihi nka ka m’bia-kwa-ra nārugharighi uka, mb͕e eji kpọtam. Ya mere anamaju, Òkwu gini mere unu ji kpọtam?

30 Kọniliọs we si, Ubọchi anọ gara aga, rue oge hour nka, m’nēkpe ekpere n’oge hour nke-iteghete n’ulom; ma le, otù nwoke guzoro n’irum n’uwe nēnwu enwu,

31 si, Kọniliọs, anuru ekpere-gi, echeta-kwa-ra ọlu ebere gi nile n’iru Chineke.

32 Ya mere ziga na Jọpa, kpọtara onwe-gi Saimon, onye anākpọ kwa Pita; onye ahu nānọ dika ọbìa n’ulo Saimon, bú onye nēdozi akpukpọ anu n’usọ oké osimiri.

33 Ya mere n’otù oge ahu ka m’zigara gi; gi onwe-gi me-kwa-ra nke-ọma na i biawo. Ya mere ub͕u a ayi onwe-ayi nile nọ n’ebe a n’iru Chineke, inu ihe nile nke Onye-nwe-ayi nyeworo gi n’iwu.

34 Pita we saghe ọnu-ya, si,

N’ezie anamaghọta na Chineke abughi onye nēle madu anya n’iru:

35 kama nime mba ọ bula onye nātu egwu Ya, onye nālu kwa ọlu ezi omume, bu onye Ọ nānara nke-ọma.

36 Okwu nke O zitere umu Israel, nēzisa ozi ọma nke udo site n’ọnu Jisus Kraist (Onye ahu bu Onye-nwe madu nile)

37 akukọ ahu unu onwe-unu matara, nke putara ìhè na Judia dum, nāmalite site na Galili, mb͕e baptism nke Jọn kwusara gasiri;

38 bú Jisus Nke si na Nazaret puta, otú Chineke were Mọ Nsọ na ike te Ya dika manu-otite: Onye jeghariri nālu ọlu ọma, nēme kwa ka aru di ha ike, bú ndi nile ekwensu mere ha dika onye-nwe-ha; n’ihi na Chineke soro Ya.

39 Ayi onwe-ayi bu kwa ndi-àmà nke ihe nile O mere n’ala ndi-Ju, na nime Jerusalem; Onye ha b͕u-kwa-ra, nākwuba Ya n’elu osisi.

40 Onye ahu ka Chineke mere ka O si n’ọnwu bilie n’ubọchi nke-atọ, O were kwa Ya nye ka egosi Ya n’ìhè.

41 Ọ bughi ndi-Ju nile ka egosiri Ya, kama ọ bu ndi-àmà Chineke buru uzọ rọputa, bú ayi onwe-ayi, ndi soro Ya nēri nāṅu kwa mb͕e O siri na ndi nwuru anwu bilie.

42 O we nye ayi iwu ka ayi kwusara ndi-Ju, ka ayi kwusi kwa ike na Onye a bu Onye Chineke kaworo ibu Onye-ikpé nke ndi di ndu na ndi nwuru anwu.

43 Onye ahu ka ndi-amuma nile nāb͕ara àmà, na site n’aha-Ya onye ọ bula nke kwere na Ya gānata nb͕aghara nmehie.

44 Mb͕e Pita kpu akukọ ndia n’ọnu, Mọ Nsọ dakwasiri ndi nile nuru okwu ahu.

45 Ibobo we nwua ha n’aru, bú ndi kwere na Jisus ndi sitere na ndi obibì-úgwù, ka ha ra, bú ndi soro Pita bia, n’ihi na awusawo-kwa-ra onyinye nke bu Mọ Nsọ n’isi ndi mba ọzọ.

46 N’ihi na ha nānu ka ha nēkwu okwu n’asusu ọzọ di iche iche, nēme kwa ka Chineke di uku. Mb͕e ahu Pita zara, si,

47 Ọ̀ di onye puru inapu miri, ka aghara ime ndia baptism, ndi natara Mọ Nsọ dika ayi onwe-ayi?

48 O we kwue ka eme ha baptism n’aha Jisus Kraist. Mb͕e ahu ha riọrọ ya ka ọ nọgide ubọchi ufọdu.