Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 21

1 M’we hu elu-igwe ọhu na uwa ọhu: n’ihi na elu-igwe mbu ahu na uwa mbu ahu gabigarari; oké osimiri adighi kwa ọzọ.

2 M’we hu obodo nsọ ahu, bú Jesusalem ọhu, ka ọ nēsi n’elu-igwe ridata, site n’ebe Chineke nọ, edoziwo ya dika nwanyi anālu ọhu nke achọworo ya nma nye di-ya.

3 M’we nu oké olu ka ọ nēsi n’oche-eze ahu dà, si, Le, ūlọ-ikwū nke Chineke diyere madu, Ọ gēbiye-kwa-ra ha, ha onwe-ha gābu kwa ndi nke Ya, Chineke Onwe-ya gānọye-kwa-ra ha, buru kwa Chineke-ha:

4 Ọ gēhichapu kwa anya-miri nile ọ bula n’anya-ha; ọnwu agaghi-adi kwa ọzọ; iru-újú ma-ọbu ikwa-ákwá ma-ọbu aru-ufu agaghi-adi kwa ọzọ: ihe ngbu nile agabigawo.

5 Onye ahu Nke nānọkwasi n’oche-eze ahu we si, Le, anameme ihe nile ka ha di ọhu. O we si, De akwukwọ: n’ihi na okwu ndia kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa ezi-okwu.

6 O we sim, Emewo ha. Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, nmalite na ọgwugwu. Mu onwem gēnye onye akpiri nākpọ nku miri site n’isi-iyi miri nke ndu ahu n’efu.

7 Onye nēmeri gēketa ihe ndia; M’gābu-kwa-ra ya Chineke, ya onwe-ya gābu-kwa-ram nwa.

8 Ma ndi nātu ujọ, na ndi nēkweghi ekwe, na ndi-árú, na ndi-ob͕u-madu, na ndi nākwa iko, na ndi nāgwọ ńsí, na ndi nēkpere arusi, na ndi-ugha nile, òkè-ha gābu nime ọdọ ahu nke ji ọku na brimstone nēre; nke bu ọnwu nke-abua ahu.

9 Otù nime ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere ọkwa asa ahu, ndi eboro ibu ihe-otiti asa ikpe-azu, we bia; o we kpayerem uka, si, Biari, M’gēgosi gi nwanyi ahu anālu ọhu, bú nwunye Nwa-aturu ahu.

10 O we bupum nime Mọ Nsọ ga rue oké ugwu di elu, we gosim obodo nsọ ahu, bú Jerusalem, ka ọ nēsi n’elu-igwe ridata, site n’ebe Chineke nọ,

11 nēnwe ebube Chineke: ìhè ọ nēnye yiri nkume dikarisiri oké ọnu-ahia, dika nkume jasper, dika crystal:

12 o nwe-kwa-ra oké mb͕idi di elu; nwe kwa ọnu-uzọ-ama iri na abua, nwe kwa ndi-mọ-ozi iri na abua n’ọnu-uzọ-ama ahu; nwe kwa aha edekwasiworo ha, nke bu aha nke ebo iri na abua nke umu Israel:

13 n’akuku Ọwuwa-anyanwu ọnu-uzọ-ama atọ di; n’akuku Ugwu ọnu-uzọ-ama atọ di kwa; n’akuku Ndida ọnu-uzọ-ama atọ di kwa; n’akuku Ọdida-anyanwu ọnu-uzọ-ama atọ di kwa.

14 Mb͕idi obodo ahu nwe-kwa-ra ntọ-ala iri na ab͕ua, n’elu ha ka edereri aha iri na abua nke ndi-ozi iri na abua ahu nke Nwa-aturu ahu.

15 Onye ahu nke nākpayerem uka nwe-kwa-ra ihe-ọtùtù, bú amì nke ọla-edo, ka o we tùa obodo ahu, na ọnu-uzọ-ama-ya nile, na mb͕idi-ya.

16 Obodo ahu nwe-kwa-ra nkuku anọ ra nrata, ogologo-ya ra kwa ka obodobo-ya: o we were amì ahu tùa obodo ahu, orú nnù furlong na nnù iri: ogologo-ya na obodobo-ya na elu-ya ra.

17 O we tù mb͕idi-ya, ọgu cubit asa na anọ, dika ọtùtù madu si di, ya bu, nke mọ-ozi.

18 Ihe eji lu mb͕idi ahu bu jasper: obodo ahu bu kwa ọla-edo anuchara anucha, dika enyo nēnwu enwu.

19 Ewerewo nkume nile ọ bula di oké ọnu-ahia chọ ntọ-ala nke mb͕idi obodo ahu nma. Ntọ-ala mbu bu jasper; nke-abua bu sapphire; nke-atọ bu chalcedony; nke-anọ bu emerald;

20 nke-ise bu sardonyx; nke-isi bu sardius; nke-asa bu chrysolite; nke-asatọ bu beryl; nke-iteghete bu topaz; nke-iri bu chrysoprase; nke-iri-na-otù bu jacinth; nke-iri-na-abua bu amethyst.

21 Ọnu-uzọ-ama iri na abua ahu bu pearl iri na abua; eji otù pearl me ọnu-uzọ-ama ọ bula nime ọnu-uzọ-ama ahu nile: amá obodo ahu bu ọla-edo anuchara anucha, dika enyo nāhu uzọ.

22 Ọ dighi kwa ulo nsọ ọ bula m’huru nime ya: n’ihi na Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Ya na Nwa-aturu ahu, bu ulo nsọ ya.

23 Anyanwu ma-ọbu ọnwa adighi kwa obodo ahu nkpà, ka ha mukwasi ya: n’ihi na ebube Chineke nyere ya ìhè, oriọna-ya bu kwa Nwa-aturu ahu.

24 Mba nile gēwere kwa ìhè-ya jegharia: ndi-eze nke uwa nēwebata kwa ebube-ha nime ya.

25 Agaghi-emechi kwa ọnu-uzọ-ama-ya n’ehihie ma-ọli (n’ihi na abali agaghi-adi n’ebe ahu):

26 ha gēwebata kwa ebube na nsọpuru nke mba nile nime ya:

27 ọ dighi kwa ihe ọ bula emeruru emeru, ma-ọbu onye nēme ihe-árú na ugha, gābà nime ya ma-ọli: kama ọ bu nání ndi edeworo aha-ha n’akwukwọ nke ndu Nwa-aturu ahu.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 22

1 O we gosim osimiri nke miri nke ndu, nēnwu dika crystal, ka ọ nēsi n’oche-eze Chineke na nke Nwa-aturu ahu puta,

2 n’etiti amá-ya. N’akuku a na n’akuku nke-ọzọ nke osimiri ahu ka osisi nke ndu di kwa, nāmi uzọ nkpuru iri na abua, nēnye nkpuru-ya n’ọnwa n’ọnwa: akwukwọ osisi ahu bu ihe ime ka aru di mba nile ike.

3 Ọbubu-ọnu ọ bula agaghi-adi ọzọ: oche-eze Chineke na nke Nwa-aturu ahu gādi kwa nime ya: ndi-orù-Ya gēfè kwa Ya òfùfè:

4 ha gāhu kwa iru-Ya; aha-Ya gādi kwa n’egedege-iru-ha.

5 Abali agaghi-adi kwa ọzọ; ìhè oriọna na ìhè anyanwu adighi kwa ha nkpà; n’ihi na Onye-nwe-ayi Chineke gēnye ha ìhè: ha ganābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.

6 O we sim, Okwu ndia kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa ezi-okwu: Onye-nwe-ayi, bú Chineke nke ndi-mọ nke ndi-amuma, zite-kwa-ra mọ-ozi-Ya igosi ndi-orù-Ya ihe nile nāghaghi iputa na mb͕e ntà.

7 Le kwa, anamabia ọsọsọ. Ngọzi nādiri onye nēdebe okwu nile nke amuma nke akwukwọ a.

8 Mu onwem Jọn bu kwa onye nānu nāhu kwa ihe ndia. Mb͕e m’nuru, hu kwa, m’we da n’ala ikpọ isi ala n’iru ukwu mọ-ozi ahu onye nēgosim ihe ndia.

9 O we sim, Lezi anya ka i ghara ime ya: abum orù-ibe-gi, buru kwa orù-ibe nke umu-nna-gi, bú ndi-amuma, ha na ndi nēdebe okwu nile nke akwukwọ a: kpọ isi ala nye Chineke.

10 O we sim, Akala okwu nile nke amuma nke akwukwọ a akàrà; n’ihi na oge ahu di nso.

11 Onye nēme ajọ omume, ya me ajọ omume ga n’iru: onye ru-kwa-ra inyi, ka eme ka o ru inyi ga n’iru: onye ezi omume, ya me ezi omume ga n’iru: onye di kwa nsọ, ka edo ya nsọ ga n’iru.

12 Le, anamabia ọsọsọ; ugwọ-ọlum di kwa n’akam, inyeghachi onye ọ bula dika ọlu-ya si di.

13 Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, onye mbu na onye ikpe-azu, nmalite na ọgwugwu.

14 Ngọzi nādiri ndi nāsa uwe-nwuda-ha, ka ha we nwe ike n’ebe osisi nke ndu ahu di, si kwa n’ọnu-uzọ-ama ahu ba nime obodo ahu.

15 N’azu obodo ka ha di, bú nkita nile, na ndi nile nāgwọ nsi, na ndi nile nākwa iko, na ndi-ob͕u-madu nile, na ndi nēkpere arusi, na onye ọ bula nke nāhu ugha n’anya nēme kwa ya.

16 Mu onwem, bú Jisus, zitere mọ-ozim iwere ihe ndia b͕ara unu àmà nye nzukọm nile. Mu onwem bu nkpọrọgwu Devid, buru kwa nwa ọ muru, kpakpando nēnwu enwu, nke bu kwa kpakpando ututu ahu.

17 Mọ Nsọ na nwanyi ahu anālu ọhu nāsi kwa, Bia. Onye nānu, ya si kwa, Bia. Onye akpiri nākpọ kwa nku, ya bia: onye nāchọ, ya nara miri nke ndu ahu n’efù.

18 Mu onwem nāb͕ara onye ọ bula àmà, bú onye nānu okwu nile nke amuma nke akwukwọ a, si, Ọ buru na onye ọ bula gātukwasiri ha okwu, Chineke gātukwasiri ya ihe-otiti nile nke edeworo n’akwukwọ a:

19 ọ buru kwa na onye ọ bula gēwepu okwu nime okwu nile nke akwukwọ nke amuma nka, Chineke gēwepu òkè-ya n’osisi nke ndu ahu, wepu kwa òkè-ya n’obodo nsọ ahu, bú ihe edeworo n’akwukwọ a.

20 Onye ahu Nke nāb͕a àmà ndia nāsi, E: anamabia ọsọsọ. Amen: bia, Onye-nwe-ayi Jisus.

21 Ka amara Onye-nwe-ayi Jisus diyere ndi nsọ nile. Amen.