Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 11

1 Ewe nyem amì yiri nkpa-n’aka: otù onye we si, Bilie, tù kwa ulo nsọ nke Chineke, na ebe-ichu-àjà-ya, na ndi nākpọ isi ala nime ya.

2 Ma obí nke di n’èzí ulo nsọ ahu, rapu ya n’èzí, atù-kwa-la; n’ihi na ewerowo ya nye ndi mba ọzọ: ha gāzọda kwa obodo nsọ ahu ọgu ọnwa abua na abua.

3 M’gēnye kwa ndi-àmàm abua ike, ha gēbu kwa amuma nnù ubọchi atọ na ọgu atọ, eb͕okwasiwo kwa ha ákwà-nkpe.

4 Ndia bu osisi olive abua ahu na ihe-idọba-oriọna abua ahu, ndi nēguzo n’iru Onye-nwe uwa.

5 Ọ buru kwa na onye ọ bula chọrọ imejọ ha, ọku nēsi n’ọnu-ha puta, nēripia kwa ndi-iro-ha; ọ buru kwa na onye ọ bula gāchọ imejọ ha, aghaghi ib͕u ya otú a.

6 Ndia nwere ike imechi elu-igwe, ka miri we ghara izo n’ubọchi nile nke amuma-ha: ha nwe-kwa-ra ike n’ebe miri nile di, ime ka ha b͕anwè ọbara, na iwere ihe-otiti nile ọ bula tie uwa, ka mb͕e ha gāchọ ra.

7 Ma mb͕e ọ bula ha gāb͕azuwo àmà-ha, anu-ọhia ahu nke nēsi n’abyss ahu rigoputa gēbu agha megide ha, meri kwa ha, b͕u kwa ha.

8 Ozu-ha we di n’amá nke obodo uku ahu, bú nke anākpọ Sọdọm na Ijipt n’uzọ nke Mọ Nsọ, ebe akpọgide-kwa-ra Onye-nwe-ha n’obe.

9 Madu we si n’etiti ndi nile na ebo nile na asusu nile na mba nile puta nēle ozu-ha ubọchi atọ na nkera otù ubọchi, ha ekweghi kwa ka atọb͕ọ ozu-ha n’ílì.

10 Ndi bi n’elu uwa nāṅuri kwa ọṅu n’isi ha, obi nātọ kwa ha utọ; ha gēzigarita kwa onwe-ha onyinye; n’ihi na ndi-amuma abua ndia mekpara ndi bi n’elu uwa aru.

11 Mb͕e ubọchi atọ na nkera otù ubọchi ahu gasiri Mọ nke ndu nke si na Chineke puta we bata nime ha, ha we guzo n’ukwu-ha; oké egwu we dakwasi ndi nēkiri ha.

12 Ha we nu oké olu nke si n’elu-igwe da, ka ọ nāsi ha, Rigotanu n’ebe a. Ha we rigo rue n’elu-igwe nime igwe-oji ahu; ndi-iro-ha kiri-kwa-ra ha.

13 N’otù oge hour ahu oké ala-ọma-jijiji we da, otù uzọ n’uzọ iri nke obodo ahu we da rue ala; ewe b͕ue nnù madu iri na nnù asa na ọgu iri nime ala-ọma-jijiji ahu, bú ndi nwere aha: ndi fọduru we tua egwu, ha we nye Chineke nke elu-igwe otuto.

14 Ahuhu nke-abua agabigawo: le, Ahuhu nke-atọ nābia ọsọsọ.

15 Mọ-ozi nke-asa we fùa opì; oké olu we da n’elu-igwe, ha we si, Ala-eze nke uwa aghọwo ala-eze nke Onye-nwe-ayi, na nke Kraist-Ya: Ọ gābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.

16 Orú ndi-okenye na anọ ahu, ndi nānọdu n’iru Chineke n’elu oche-eze-ha, we da kpuchie iru ha n’ala, we kpọ isi ala nye Chineke,

17 si, Ayi nēkele Gi, Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Onye nādi adi, Onye di-kwa-ri; n’ihi na I werewo oké ike-Gi, I bukwa eze.

18 Mba nile we we iwe, iwe-Gi we bia, ya na oge ikpe ndi nwuru anwu ikpé, na inye ndi-orù-Gi, bú ndi-amuma, na ndi nsọ, na ndi nātu egwu aha-Gi, ndi ntà na ndi uku, ugwọ-ọlu-ha; na imebi ndi ahu nēmebi uwa.

19 Ewe meghe ulo nsọ nke Chineke nke di n’elu-igwe; ewe hu ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu-Ya n’ulo nsọ Ya; àmùmà, na olu, na éb͕è-elu-igwe, na ala-ọma-jijiji, na oké ákú-miri-ígwé we so.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 12

1 Ewe hu oké ihe-iriba-ama n’elu-igwe; nwanyi nke egbokwasiworo ya anyanwu dika uwe, ọnwa di kwa n’okpuru ukwu-ya abua, ọ nēkpu kwa okpu-eze nke kpakpando iri na abua n’isi-ya;

2 ọ di kwa ime: o we tie nkpu, ebe ime nēme ya, anēmekpa kwa ya aru imuputa nwa.

3 Ewe hu ihe-iriba-ama ọzọ n’elu-igwe; ma le, oké dragon nke nācha ọku ọku, nke nwere isi asa na mpi iri, nēkpu kwa okpu-eze asa n’isi-ya.

4 Ọdudù-ya nādọrọ kwa otù uzọ n’uzọ atọ nke kpakpando nke elu-igwe, o we tudà ha n’ala: dragon ahu we guzo n’iru nwanyi ahu onye gaje imuputa nwa, ka o we ripia Nwa-ya mb͕e ọ bula ọ gāmuputa Ya.

5 O we muputa Ọkpara, bú Nwa-nwoke, Onye gēji nkpa-n’aka ígwè zù mba nile dika aturu: ewe punara ya Nwa-ya ahu la n’ebe Chineke nọ, na n’ebe oche-eze-Ya di.

6 Nwanyi ahu we b͕alaga nime ọhia, ebe o nwere ọnọdu edoziworo site n’aka Chineke, ka ha we zùa ya n’ebe ahu nnù ubọchi atọ na ọgu atọ.

7 Agha we puta n’elu-igwe: Maikael na ndi-mọ-ozi-ya buru agha megide dragon ahu; dragon ahu na ndi-mọ-ozi-ya we bue agha;

8 ha enweghi kwa ike, ahughi kwa ọnọdu-ha ọzọ n’elu-igwe.

9 Ewe chudà dragon uku ahu, bú agwọ ochie ahu, onye anākpọ Ekwensu na Setan, onye nēduhie uwa nile madu bi; achudara ya n’uwa, chudà kwa ndi-mọ-ozi-ya, ha na ya.

10 M’we nu oké olu ka ọ nādà n’elu-igwe, si, Ub͕u a ka ọ biaworo, bú nzọputa ahu, na ike ahu, na ala-eze Chineke-ayi, na ichi-isi nke Kraist-Ya: n’ihi na achudara onye ahu nke nēbo umu-nna-ayi ebubo, onye nēbo ha ebubo n’iru Chineke-ayi ehihie na abali.

11 Ndi ahu we merie ya n’ihi ọbara Nwa-aturu ahu, na n’ihi okwu àmà-ha; ha ahughi kwa ndu-ha n’anya rue ọnwu.

12 N’ihi nka, ka obi nātọ unu utọ, unu elu-igwe nile, na unu ndi bi nime ha. Ahuhu gādiri uwa na oké osimiri: n’ihi na ekwensu aridakuruwo unu, nēnwe oké ọnuma, ebe ọ matara na o nwere nání nwa oge.

13 Mb͕e dragon ahu huru na achudara ya-ri n’uwa, o we sob͕ue nwanyi ahu, bú nwanyi nke muputara Nwa-nwoke ahu.

14 Ewe nye nwanyi ahu nkù abua ahu nke oké ugo ahu, ka o we febà n’ọhia la n’ọnọdu-ya, ebe anāzù ya otù oge, na oge abua, na nkera otù oge, ka ọ pua n’iru agwọ ahu.

15 Agwọ ahu we b͕uputa miri n’ọnu-ya n’azu nwanyi ahu dika osimiri, ka o we me ka osimiri ahu bupu ya.

16 Ala we yere nwanyi ahu aka, ala we saghe ọnu-ya, loda osimiri ahu, nke dragon ahu b͕uputara n’ọnu-ya.

17 Dragon ahu we wesa nwanyi ahu iwe, we pua ibu agha megide nkpuru-ya fọduru, bú ndi nēdebe ihe nile Chineke nyere n’iwu, ndi nēnwe kwa àmà nke Jisus:

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 13

1 o we guzọ n’ájá oké osimiri.

M’we hu anu-ọhia ka ọ nēsi n’oké osimiri rigoputa, nēnwe mpi iri na isi asa, nēkpu kwa okpu-eze iri n’elu mpi-ya, nēnwe kwa aha ufọdu nke nkwulu Chineke n’elu isi-ya.

2 Anu-ọhia nke m’huru yi-kwa-ra agu, ukwu-ya di kwa ka ukwu bear, ọnu-ya di kwa ka ọnu ọdum: dragon ahu we nye ya ike-ya, na oche-eze-ya, na oké ichi-isi.

3 M’we hu otù n’etiti isi asa ya, dika agāsi na etib͕uru ya-ri ọ nwua; ewe me ka ihe-otiti-ya ahu nke nēweta ọnwu la: o we ju uwa dum anya, ha we so anu-ọhia ahu n’azu;

4 ha we kpọ isi ala nye dragon ahu, n’ihi na o nyere anu-ọhia ahu ichi-isi-ya; ha kpọ-kwa-ra isi ala nye anu-ọhia ahu, si, Ònye yiri anu-ọhia ahu? ònye pu-kwa-ra ibu agha megide ya?

5 ewe nye ya ọnu nke nēkwu oké ihe n’ikwulu Chineke; ewe nye ya ike ime omume-ya ọgu ọnwa abua na abua.

6 O we saghe ọnu-ya ikwulu Chineke, ikwulu aha-Ya, na ulo-ikwū-Ya, bú ndi bi n’elu-igwe.

7 Ewe nye ya ike ibu agha megide ndi nsọ ahu, na imeri ha: enye-kwa-ra ya ike ichi ebo nile ọ bula na ndi nile ọ bula na asusu nile ọ bula na mba nile ọ bula isi.

8 Ndi nile ndi bi n’elu uwa gākpọ kwa isi ala nye ya, onye ọ bula anēdeghi aha-ya n’akwukwọ nke ndu nke Nwa-aturu ahu Onye eb͕uworo site n’oge itọ ntọ-ala nke uwa.

9 Ọ buru na onye ọ bula nwere nti, ya nu.

10 Ọ buru na ọ diri onye ọ bula ka adọta ya n’agha, ọ bu n’agha ka agādọta ya: ọ buru na onye ọ bula gēji mma-agha b͕u madu, aghaghi iji mma-agha b͕u ya. Nebe a ka ntachi-obi na okwukwe nke ndi nsọ di.

11 M’we hu anu-ọhia ọzọ ka ọ nēsi n’ala rigoputa; o nwe-kwa-ra mpi abua yiri nke Nwa-aturu ahu, ma ọ nēkwu okwu dika dragon ahu.

12 O we nāchi isi nile nke anu-ọhia mbu ahu n’iru ya. Ọ nēme kwa uwa na ndi bi nime ya ka ha kpọ isi ala nye anu-ọhia mbu ahu, nke emere ka ihe-otiti-ya nke nēweta ọnwu la.

13 ọ nēme kwa oké ihe-iriba-ama di iche iche, ka o we me ọbuná ọku ka o si n’elu-igwe ridata n’uwa n’iru madu nile.

14 O we nēduhie ndi bi n’elu uwa n’ihi ihe-iriba-ama nile nke enyere ya ike ime n’iru anu-ọhia ahu; nāsi ndi bi n’elu uwa, ka ha kpuara anu-ọhia ahu ihe-oyiyi, bú nke nwere ob͕ub͕u-mma-agha ahu, we di ndu.

15 Ewe nye ya ike inye ya ume, bú ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu, ka ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu we kwue okwu, me kwa ka eb͕ue ha, ka ha ra, bú ndi ọ bula nākpọghi isi ala nye ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu.

16 Ọ nēme kwa madu nile, ndi ntà na ndi uku, na ndi-ọgaranya na ndi-ob͕eye, na ndi nwere onwe-ha na ndi-orù, ka akà ha akàrà n’aka-nri-ha, ma-ọbu n’egedege-iru-ha;

17 ka onye ọ bula ghara kwa ipu izuta ahia ma-ọbu ire ihe, ma-ọbughi onye nwere akàrà ahu, bú aha nke anu-ọhia ahu ma-ọbu ọnu-ọgugu aha-ya.

18 N’ebe a ka amam-ihe di. Onye nwere uche, ya gua ọnu-ọgugu nke anu-ọhia ahu; n’ihi na ọ bu ọnu-ọgugu madu: ọnu-ọgugu-ya bu kwa nnù na ọgu iri na ọgu atọ na isi.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 14

1 M’we hu, ma le, Nwa-aturu ahu ka Ọ nēguzo n’ugwu Zaion, Ya na ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ, bú ndi edeworo aha-Ya na aha Nna-Ya n’egedege-iru-ha.

2 M’we nu olu ka ọ nēsi n’elu-igwe dà, dika olu ọtutu miri, di kwa ka olu oke éb͕è-elu-igwe: olu ahu m’nuru di kwa ka olu ndi nākpọ ubọ-akwara mb͕e ha nēwere ubọ-akwara-ha nākpọ:

3 ha we nābù dika agāsi na ọ bu abù ọhu n’iru oche-eze ahu, na n’iru ihe anọ ahu nke di ndu na ndi-okenye ahu: ọ dighi kwa onye ọ bula puru imuta abù ahu ma-ọbughi ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ ahu, bú ndi ab͕atarari n’uwa.

4 Ndia bu ndi nēmerughi onwe-ha n’aru ndinyom; n’ihi na ha di ọcha ka umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Ndia bu ndi nēso Nwa-aturu ahu ebe ọ bula Ọ nēje. Ndia ka ab͕atara n’etiti madu, iburu Chineke na Nwa-aturu ahu nkpuru mbu.

5 Ọ dighi kwa ugha ọ bula ahuru n’ọnu-ha: ha bu ndi anātaghi uta.

6 M’we hu mọ-ozi ọzọ ka ọ nēfe n’etiti elu-igwe, nēnwe ozi ọma ebighi-ebi izisara ndi nānọdu n’elu uwa, bú mba nile ọ bula na ebo nile ọ bula na asusu nile ọ bula na ndi nile ọ bula;

7 ọ nēwere kwa oké olu si, Tuanu egwu Chineke, nye kwa Ya otuto; n’ihi na oge hour nke ikpé-Ya abiawo: kpọ-kwa-nu isi ala nye Ya, bú Onye kère elu-igwe na ala, oké osimiri na isi-iyi nile nke miri nile.

8 Mọ-ozi ọzọ, bú nke-abua, we so, si, Ọ dawo, ọ dawo, bú Babilon uku ahu, nke meworo ka mba nile ṅua nime manya nke ọnuma nke ikwa-iko-ya.

9 Mọ-ozi ọzọ, bú nke-atọ, we so ha, were oké olu si, Ọ buru na onye ọ bula nākpọ isi ala nye anu-ọhia ahu na ihe-oyiyi-ya, nānata kwa akàrà-ya n’egedege-iru-ya, ma-ọbu n’aka-ya,

10 ya onwe-ya gāṅu kwa nime manya nke ọnuma Chineke, nke edoziworo nāgwaghi-agwa nime iko nke iwe-Ya; agēji kwa ọku na brimstone mekpa ya aru n’iru ndi-mọ-ozi di nsọ, na n’iru Nwa-aturu ahu:

11 anwuru-ọku nke nmekpa-aru-ha nārigo rue mb͕e nile ebighi-ebi; ha adighi-ezu kwa ike ehihie na abali, bú ndi nākpọ isi ala nye anu-ọhia ahu na ihe-oyiyi-ya, ma ọ buru kwa na onye ọ bula anata akàrà nke aha-ya.

12 N’ebe a ka ntachi-obi ndi nsọ di, bú ndi nēdebe ihe Chineke nyere n’iwu, na okwukwe Jisus.

13 M’we nu olu ka ọ nēsi n’elu-igwe da, si, De akwukwọ, Ngọzi nādiri ndi nwuru anwu, bú ndi gānwu anwu nime Onye-nwe-ayi site n’ub͕u a: e, ka Mọ Nsọ nēkwu, ka ha we si na ndọb͕u nile ha dọb͕uru onwe-ha n’ọlu zuru ike; n’ihi na ọlu nile ha nēso ha ga.

14 M’we hu, ma le, ígwé ọcha; n’elu ígwé ọcha ahu ka m’huru otù Onye yiri nwa nke madu ka Ọ nānọdu ala, nēkpu okpu-eze nke ọla-edo n’isi-Ya, mma-iwe-ihe-ubi di nkọ di kwa n’aka-Ya.

15 Mọ-ozi ọzọ we si n’ulo nsọ ahu puta, nēwere oké olu tiere Onye ahu Nke nānọkwasi n’ígwé ọcha ahu nkpu, si, Tiye mma-iwe-ihe-ubi-Gi, we kwa ihe-ubi: n’ihi na oge hour iwe ihe-ubi abiaruwo; n’ihi na ihe agēwe n’ubi nke uwa achabigawo ókè.

16 Onye ahu Nke nānọkwasi n’ígwé ọcha ahu we tudà mma-iwe-ihe-ubi-Ya n’elu uwa; ewe were uwa dika ihe-ubi.

17 Mọ-ozi ọzọ we si n’ulo nsọ ahu nke di n’elu-igwe puta, ya onwe-ya nwe-kwa-ra mma-iwe-ihe-ubi di nkọ.

18 Mọ-ozi ọzọ we si n’ebe-ichu-àjà ahu puta, bú onye nwere ike n’ebe ọku ahu di; o we were oké olu tiere onye ahu nke nwere mma-iwe-ihe-ubi di nkọ nkpu, si, Tiye mma-iwe-ihe-ubi-gi di nkọ, bipu uyọkọ nile nke vine nke uwa; n’ihi na nkpuru-vine-ya achazuwo.

19 Mọ-ozi ahu we tubà mma-iwe-ihe-ubi-ya n’uwa, we bipu nkpuru-vine nke uwa, tubà ya nime ebe-nzọcha-nkpuru-vine ahu, nke di uku, bú nke ọnuma Chineke.

20 Ewe zọcha ebe-nzọcha-nkpuru-vine ahu n’azu obodo ahu, ọbara we si n’ebe-nzọcha-nkpuru-vine ahu puta, rue bridle inyinya, ru kwa ihe ra ka nnù furlong anọ.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 15

1 M’we hu ihe-iriba-ama ọzọ n’elu-igwe, nke di uku di kwa ebube, ndi-mọ-ozi asa ndi nwere ihe-ọtiti asa, nke bu nke-ikpe-azu, n’ihi na nime ha ka ọnuma Chineke gwuru.

2 M’we hu dika agāsi na ọ bu oké osimiri eji enyo me nke agwakọworo ya na ọku; ahu-kwa-ram ndi nāputa n’aka anu-ọhia ahu na nmeri, ya na n’aka ihe-oyiyi-ya, na n’aka ọnu-ọgugu aha-ya, ka ha nēguzo n’usọ oké osimiri ahu eji enyo me, nēnwe ubọ-akwara nke Chineke.

3 Ha nābù kwa abù nke Moses, bú orù nke Chineke, na abù nke Nwa-aturu Chineke, si, Ọlu-Gi nile di uku di kwa ebube, Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile; uzọ-Gi nile ziri ezi, buru kwa ezi-okwu, Gi Eze nke mba nile.

4 Ònye nāgaghi-atu egwu, Onye-nwe-ayi, to kwa aha-Gi? n’ihi na nání Gi di ọcha n’obi; n’ihi na mba nile gābia kpọ kwa isi ala n’iru Gi; n’ihi na emere ka ezi omume-Gi nile puta ìhè.

5 Mb͕e ihe ndia gasiri m’we hu, emeghe-kwa-ra ulo nsọ nke ulo-ikwū nke àmà ahu n’elu-igwe:

6 ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere ihe-otiti asa ahu we si n’ulo nsọ ahu puta, eb͕okwasiworo ha linen, nke di ọcha nēnwu kwa enwu, ekewo kwa ha ihe-ọkiké ọla-edo n’obi gburugburu.

7 Otù nime ihe anọ ahu nke di ndu we nye ndi-mọ-ozi asa ahu ọkwa ọla-edo asa juputara n’ọnuma Chineke, Onye nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi.

8 Ulo nsọ ahu we juputa n’anwuru-ọku nke si n’ebube Chineke puta, si kwa n’ike-Ya puta; ọ dighi kwa onye ọ bula puru ibà nime ulo nsọ ahu, rue mb͕e ihe-otiti asa ahu nke ndi-mọ-ozi asa ahu gāgwu.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 16

1 M’we nu oké olu ka ọ nēsi n’ulo nsọ ahu dà, nāsi ndi-mọ-ozi asa ahu, Jenu, wusi ọkwa asa ahu nke ọnuma Chineke nime uwa.

2 Mọ-ozi mbu we je, wusi ọkwa-ya nime uwa; ajọ ọnyá jọb͕uru onwe-ya we puta n’aru madu nile ndi nwere akàrà anu-ọhia ahu, ndi nākpọ kwa isi ala nye ihe-oyiyi-ya.

3 Mọ-ozi nke-abua we wusi ọkwa-ya nime oké osimiri; o we ghọ ọbara dika nke madu nwuru anwu; nkpuru-obi nile ọ bula nke di ndu we nwua, bú ihe di n’oké osimiri.

4 Mọ-ozi nke-atọ we wusi ọkwa-ya nime osimiri nile na isi-iyi nile nke miri nile; miri ahu we ghọ ọbara.

5 M’we nu mọ-ozi miri nile ka ọ nāsi, Onye ezi omume ka I bu, Gi Onye nādi adi, Onye di-kwa-ri, Onye di ọcha n’obi, n’ihi na I kpere ikpé ndia:

6 n’ihi na ha wusiri ọbara ndi nsọ na ndi-amuma, ọbara ka I nyewo-kwa-ra ha ka ha ṅua: ha bu ndi kwesiri ekwesi.

7 M’we nu ebe-ichu-àjà ahu ka ọ nāsi, E, Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, ikpé-Gi nile bu ezi-okwu na ikpé ziri ezi.

8 Mọ-ozi nke-anọ we wusi ọkwa-ya n’elu anyanwu; ewe nye ya ike iji ọku chab͕u madu.

9 Ewe were oké okpom-ọku chab͕ue madu: ha we kwulu aha Chineke ahu Onye nwere ike ichi ihe-otiti ndia isi; ha echègharighi kwa inye Ya otuto.

10 Mọ-ozi nke-ise we wusi ọkwa-ya n’elu oche-eze nke anu-ọhia ahu; ewe me ka ala-eze-ya b͕a ọchichiri; ha we tabìe ire-ha site n’aru-ufu,

11 ha we kwulu Chineke nke elu-igwe site n’aru-ufu nile ha na ọnyá nile ha; ha echègharighi kwa isi n’ọlu nile ha puta.

12 Mọ-ozi nke-isi we wusi ọkwa-ya n’elu osimiri uku ahu, bú Yufretis; miri-ya we tasia, ka ewe dozie uzọ ndi-eze ahu ndi si n’ọwūwa-anyanwu bia.

13 M’we hu ndi-mọ atọ nādighi ọcha, dika awọ̀, ka ha nēsi n’ọnu dragon ahu, si kwa n’ọnu anu-ọhia ahu, si kwa n’ọnu onye-amuma ugha ahu, puta:

14 n’ihi na ha bu mọ nke ndi-mọ ọjọ, nēme ihe-iriba-ama di iche iche; ndi nāpukuru ndi-eze nke elu-uwa dum madu bi, ime ka ha zukọ ibu agha nke oké ubọchi ahu nke Chineke, Onye puru ime ihe nile.

15 (Le, anamabia dika onye-ori. Ngọzi nādiri onye nēche nche, nēdebe kwa uwe-ya, ka ọ ghara ijeghari n’ọtọ, ha we hu ihere-ya.)

16 Ha we me ka ha zukọ n’ebe ahu nke anākpọ n’asusu Hibru Amagedọn.

17 Mọ-ozi nke-asa we wusi ọkwa-ya n’elu mbara-elu-igwe; oké olu we si n’ulo nsọ ahu daputa, si n’ebe oche-eze ahu di, nāsi, Emewo ya:

18 àmùmà, na olu, na éb͕è-elu-igwe, we so; oké ala-ọma-jijiji so-kwa-ra, nke ala-ọma-jijiji di otú a adaghi mb͕e ọ bula site na mb͕e madu putara n’elu uwa, ala-ọma-jijiji di uku otú a, oké ala-ọma-jijiji di otú a.

19 Ewe kewa obodo uku ahu uzọ atọ, obodo nile nke mba nile we da: ewe cheta Babilon uku ahu n’iru Chineke, inye ya iko nke manya nke ọnuma nke iwe-Ya.

20 Agwe-etiti nile ọ bula we b͕alaga, ahughi kwa ugwu nile ọzọ.

21 Oké ákú-miri-ígwé, nke ra ka talent n’arọ́ n’otù, nēsi kwa n’elu-igwe ridata n’aru madu: madu we kwulu Chineke site n’ihe-otiti nke ákú-miri-ígwé ahu; n’ihi na ihe-otiti-ya di uku ri nne.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 17

1 Otù mọ-ozi n’etiti ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere ọkwa asa ahu we bia, we kpayerem uka, si, Biari, m’gēgosi gi ikpé nke oké nwanyi ahu nākwa iko onye nānọkwasi n’ọtutu miri;

2 onye ya na ndi-eze uwa kwara iko, eme-kwa-ra ka manya ikwa-iko-ya bà ndi bi n’uwa n’anya.

3 O we bupum ba n’ọhia nime Mọ Nsọ: m’we hu nwanyi ka ọ nānọkwasi n’anu-ọhia nācha uhie uhie, nke nwere aha di iche iche juputara na nkwulu Chineke, nwe kwa isi asa na mpi iri.

4 Eb͕okwasiwo kwa nwanyi ahu ákwà ododo na ákwà uhie, ewerewo kwa ọla-edo na nkume di oké ọnu na pearl chọ ya nma, o nwe-kwa-ra ìko ọla-edo n’aka-ya nke juputara n’ihe-árú, bú ihe nile nādighi ọcha nke ikwa-iko-ya,

5 edekwasi-kwa-rari aha n’egedege-iru-ya, bú IHE-OMIMI, BABILON UKU AHU, NNE NKE NDI NÁKWA IKO NA NKE IHE-ÁRÚ NILE NKE UWA.

6 M’we hu nwanyi ahu ka ọbara ndi nsọ na ọbara ndi-àmà Jisus nābà ya n’anya dika manya. Mb͕e m’huru ya o we jum anya nke-uku.

7 Mọ-ozi ahu we sim, N’ìhi gini ka o juru gi anya? mu onwem gāgwa gi ihe-omimi nke nwanyi ahu, na nke anu-ọhia ahu nke nēburu ya, nke nwere isi asa ahu na mpi iri ahu.

8 Anu-ọhia ahu nke i huru diri, ọ dighi kwa ub͕u a; ọ gaje kwa isi n’abyss ahu rigoputa, na ila n’iyì. Ọ gēju kwa ndi bi n’elu uwa anya, bú ndi anēdeghi aha-ha n’akwukwọ nke ndu ahu site n’oge itọ ntọ-ala uwa, mb͕e ha nēle anu-ọhia ahu anya, na ọ diri, ọ dighi kwa ub͕u a, ọ gābia kwa.

9 N’ebe a ka uche nke nwere amam-ihe di. Isi asa ahu bu ugwu asa, nke nwanyi ahu nānọdu n’elu ha:

10 ndi-eze asa di kwa; ise nime ha adawo, otù nime ha nādi adi, onye fọduru akābiaghi; mb͕e ọ gābia ọ ghaghi kwa inọgide nwa oge.

11 Anu-ọhia ahu nke diri, nke nādighi kwa ub͕u a, ya onwe-ya bu kwa nke-asatọ, o si kwa n’asa ahu puta; ọ nāla kwa n’iyì.

12 Mpi iri ahu nke i hu-kwa-ra bu eze iri, madu ndi akānataghi ala-eze ọ bula; ma ha nānata ike dika ndi-eze, ha na anu-ọhia ahu, otù oge hour.

13 Ndia nwere otù ọlū, ha nēwere kwa ike-ha na ichi-isi-ha nye anu-ọhia ahu.

14 Ndia gēbu agha megide Nwa-aturu ahu, Nwa-aturu ahu gēmeri kwa ha, n’ihi na Ọ bu Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile, na Eze kachasi ndi-eze nile; ndi soro Ya gēmeri kwa, bú ndi akpọworo, ndi arọputawo-kwa-ra, ndi kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi.

15 O we sim, Miri nile i huru, ebe nwanyi ahu onye nākwa iko nānọdu, bu ndi di iche iche, na ìgwè madu, na mba di iche iche, na asusu di iche iche.

16 Mpi iri ahu i huru, ha na anu-ọhia ahu, ndia gākpọ nwanyi ahu nākwa iko asì, ha gēme kwa ya ka ọ buru onye tọb͕ọrọ n’efu buru kwa onye b͕a ọtọ, ha gēri kwa anu-aru-ya, rechapu kwa ya n’ọku.

17 N’ihi na Chineke tiyere n’obi-ha ime ìzù-Ya, na ib͕ata otù ìzù, na iwere ala-eze-ha nye anu-ọhia ahu, rue mb͕e agēmezu okwu nile nke Chineke.

18 Ma nwanyi ahu i huru bu obodo uku ahu, nke nwere ala-eze nāchi ndi-eze uwa.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 18

1 Mb͕e ihe ndia gasiri m’we hu mọ-ozi ọzọ ka o nēsi nelu-igwe ridata, nēnwe ike uku; ewe site n’ebube-ya nye uwa ìhè.

2 O we were olu ike tie nkpu, si, Ọ dawo, ọ dawo, bú Babilon uku ahu, ọ ghọwo kwa ebe-obibi nke ndi-mọ ọjọ, na ulo-nkpọrọ nke mọ nile ọ bula nādighi ọcha, na ulo-nkpọrọ nke nnunu nile ọ bula nke nādighi ọcha nke akpọwo-kwa-ra asì.

3 N’ihi na mba nile adawo site na manya nke ọnuma nke ikwa-iko-ya; ndi-eze uwa so-kwa-ra ya kwa iko, ndi-ahia nke uwa buru ọgaranya site n’ike nke inupu-isi-ya.

4 M’we nu olu ọzọ ka o nēsi n’elu-igwe dà, si, Ndi nkem, sinu nime ya puta, ka unu we ghara iso ya nwekọ nmehie-ya nile, ghara kwa inata ufọdu nime ihe-otiti-ya nile:

5 n’ihi na nmehie-ya nile rapakọrọ n’otù rue elu-igwe, Chineke cheta-kwa-ra ajọ omume-ya nile.

6 Nyeghachinu ya ọbuná dika ya onye-ya nyeghachiri madu, nye-kwa-nu ya okpukpu abua dika ọlu-ya nile di: nime iko ahu ọ kwara akwa, kwaranu ya okpukpu abua.

7 Ka ha ra, bú otuto o nyere onwe-ya, na inupu-isi ọ nupuru, nyenu ya nmekpa-aru na iru-újú ra otú ahu: n’ihi na ọ nāsi n’obi-ya, Anamanọdu dika eze-nwanyi, abughikwa m nwanyi di-ya nwuru, ọ dighi kwa iru-újú m’gāhu ma-ọli.

8 N’ihi nka ọ bu n’otù ubọchi ka ihe-otiti-ya nile gābia, bú ọnwu, na iru-újú, na unwu; agērechapu kwa ya n’ọku; n’ihi na Ọ di ike, bú Onye-nwe-ayi Chineke, Onye kpere ya ikpé.

9 Ndi-eze uwa, ndi soro ya kwa iko nupu kwa isi, ha gākwa-kwa-ra ya ákwá, ti-kwa-ra ya aka n’obi, mb͕e ha gēle anwuru-ọku nke orire-ọku-ya anya,

10 ka ha nēguzo n’ebe di anya n’ihi egwu nke nmekpa-aru-ya, nāsi, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, Babilon, bú obodo ahu di ike! n’ihi na n’otù oge hour ka ikpé-gi biara.

11 Ndi-ahia nke uwa nākwa-kwa-ra ya ákwá, nēru-kwa-ra ya újú, n’ihi na ọ dighi onye ọ bula nāzu ihe-ahia-ha ọzọ, bú nke ha nēweta n’ub͕ọ-ha;

12 ihe-ahia ọla-edo, na ọla-ọcha, na nkume di oké ọnu-ahia, na pearl, na ezi ákwà ọcha, na ákwà ododo, na nkisi, na ákwà uhie; na osisi nile ọ bula nēsì ísì utọ, na ihe nile ọ bula eji ọdu me, na ihe nile ọ bula eji osisi dikarisiri oké ọnu-ahia, ma-ọbu ọla, ma-ọbu ígwè, ma-ọbu marble, me;

13 na cinnamon, na amomum, na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na manu-otite, na frankincense, na manya-vine, na manu, na utu ọkà, na ọka, na anu-ulo, na aturu; na ihe-ahia nke bu inyinya na ub͕ọ-ala na aru madu; na nkpuru-obi madu.

14 Nkpuru-osisi nile nke nāgu nkpuru-obi-gi apuwo n’ebe i nọ, ihe nile nātọ utọ nke ma-kwa-ra nma apuwo kwa n’aka-gi la n’iyì, madu agaghi-ahu kwa ha ọzọ ma-ọli.

15 Ndi-ahia ndi nāzu ihe ndia, ndi gburugburu ọgaranya site na ya, ha gēguzo n’ebe di anya n’ihi egwu nke nmekpa-aru-ya, nākwa ákwá, nēru kwa újú;

16 nāsi, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, nke eb͕okwasiworo ya ezi ákwà ọcha na ákwà nācha ọbara-ọbara na ákwà uhie, nke ewerewo-kwa-ra ọla-edo na nkume di oké ọnu-ahia na pearl ke ya!

17 n’ihi na n’otù oge hour emere ka oké àkù di otú a tọb͕ọ n’efu. Ndi-isi-ub͕ọ nile n’otù n’otù, na onye ọ bula nke nēje n’ebe ọ bula n’ub͕ọ, na ndi-ub͕ọ, ka ha ra kwa, bú ndi nālu ọlu nime oké osimiri, ha guzo-kwa-ra n’ebe di anya,

18 ti kwa nkpu mb͕e ha nēle anwuru-ọku nke orire-ọku-ya anya, si Òbodo gini yiri obodo uku a?

19 Ha we kpokwasi ájá n’isi-ha, ti kwa nkpu, nākwa ákwá, nēru kwa újú, si, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, nke ndi nile ndi nwere ub͕ọ-ha n’oké osimiri buru ọgaranya nime ya site n’ibi-obi-ya di oké ọnu-ahia! n’ihi na n’otù oge hour ka emere ka ọ tọb͕ọ n’efu.

20 Ka obi nātọ gi utọ n’isi ya, gi elu-igwe, na unu ndi nsọ, na unu ndi-ozi, na unu ndi-amuma; n’ihi na Chineke kpere ikpé-unu n’aru ya.

21 Otù mọ-ozi nke di ike we būru nkume, dika oké nkume-igwe-nri, we tubà ya nime oké osimiri, si, Otú a ka agātuda Babilon, bú obodo uku ahu, n’oké ọdida, agaghi-ahu kwa ya ọzọ ma-ọli.

22 Agaghi-anu kwa olu ndi nākpọ ubọ-akwara na ndi nākpọ ubọ ọzọ na ndi nēb͕u ọ̀jà na ndi nāfù opì nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-ahu kwa onye-ọ̀kà ọ bula, nke nēme ǹkà ọ bula, nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-anu kwa olu nke nkume-igwe-nri nime gi ọzọ ma-ọli;

23 ìhè nke oriọna agaghi-enwu kwa nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-anu kwa olu nke onye nālu nwunye ọhu na nke nwanyi anālu ọhu nime gi ọzọ ma-ọli: n’ihi na ndi-ahia-gi buri ndi-amadi nke uwa; n’ihi na ewere igwọ-nsi-gi duhie mba nile.

24 Ọ bu kwa nime ya ka ahuru ọbara nke ndi-amuma na nke ndi nsọ, na nke ndi nile eb͕uworo n’elu uwa.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 19

1 Mb͕e ihe ndia gasiri m’we nu ihe dika oké olu nke oké ìgwè ndi nọ n’elu-igwe, nāsi, Haleluya; Nzọputa nile na otuto nile na ike nile nādiri Chineke-ayi:

2 n’ihi na ikpé-Ya nile bu ezi-okwu buru kwa ikpé ziri ezi; n’ihi na O kpere oké nwanyi ahu nākwa iko ikpé, bú nwanyi nke were ikwa-iko-ya mebie uwa, Ọ bọ̀-kwa-ra ọ́bọ̀ ọbara ndi-orù-Ya n’isi-ya.

3 Nke mere ya abua ha we si, Haleluya. Anwuru-ọku-ya nārigo elu rue mb͕e nile ebighi-ebi.

4 Orú ndi-okenye na anọ ahu na ihe anọ ahu nke di ndu we da n’ala, kpọ isi ala nye Chineke, bú Onye nānọkwasi n’oche-eze ahu, si, Amen; Haleluya.

5 Otù olu we site n’oche-eze ahu da, si, Nētonu Chineke-ayi, unu ndi-orù-Ya nile, ndi nātu egwu Ya, ndi ntà na ndi uku.

6 M’we nu ihe dika olu nke oké ìgwè ndi, di kwa ka olu ọtutu miri, di kwa ka olu éb͕è-elu-igwe di ike, nāsi, Haleluya: n’ihi na Onye-nwe-ayi Chineke-ayi, Onye puru ime ihe nile, nābu eze.

7 Ka ayi ṅuria ọṅu, ka obi nātọ kwa ayi utọ nke-uku, ka ayi were kwa otuto nile nye Ya: n’ihi na ọlulu-nwunye nke Nwa-aturu ahu abiawo, nwunye-Ya edoziwo kwa onwe-ya.

8 Ewe kweyere ya ka o b͕okwasi onwe-ya ezi ákwà ọcha nēnwu enwu, nke di kwa ọcha: n’ihi na ezi ákwà ọcha ahu bu ezi omume nile nke ndi nsọ.

9 O we sim, De akwukwọ, Ngọzi nādiri ndi akpọworo ibia na nri-anyasi ọlulu-nwunye nke Nwa-aturu ahu. O we sim, Ndia bu okwu nke Chineke kwuru n’ezie.

10 M’we da n’ala n’iru ukwu-ya ikpọ isi ala nye ya. O we sim, Lezi anya ka i ghara ime ya: abum orù-ibe-gi, buru kwa orù-ibe nke umu-nna-gi nke nwere àmà nke Jisus: kpọ isi ala nye Chineke: n’ihi na àmà nke Jisus bu mọ nke amuma.

11 M’we hu elu-igwe ka o gheworo oghe; ma le, inyinya ọcha di, na Onye nānọkwasi ya, bú Onye anākpọ Onye kwesiri ntukwasi-obi na Onye-ezi-okwu; ọ bu kwa n’ezi omume ka Ọ nēkpe ikpé, nēbu kwa agha.

12 Anya-Ya abua buru kwa ire ọku, Ọ nēkpu kwa ọtutu okpu-eze n’isi-Ya; O nwe-kwa-ra aha edeworo, nke ọ nādighi onye ọ bula matara, ma-ọbughi Ya onwe-ya.

13 Eb͕okwasiwo kwa Ya uwe nke efesaworo ọbara: akpọwo kwa aha-Ya Okwu Chineke.

14 Usu nile nke ndi-agha ndi di n’elu-igwe we so Ya n’elu inyinya ọcha, nēyi ezi ákwà ọcha, nke di ọcha nēnwu kwa enwu.

15 Mma-agha di nkọ nēsi kwa n’ọnu-Ya puta, ka O we were ya tib͕ue mba nile: Ya onwe-ya gēwere kwa nkpa-n’aka nke ígwè zùa ha dika aturu: Ya onwe-ya nāzọ kwa ebe-nzọcha-nkpuru-vine nke manya nke ọnuma nke iwe Chineke Onye puru ime ihe nile.

16 O nwe-kwa-ra aha edekwasiworo n’elu uwe-Ya na n’elu apata-ukwu-Ya, EZE kachasi NDI-EZE nile, NA ONYE-NWENU kachasi NDI-NWENU nile.

17 M’we hu otù mọ-ozi ka ọ nēguzo nime anyanwu; o we were oké olu tie nkpu, nāsi nnunu nile nke nēfe n’etiti elu-igwe, Bianu, zukọ iri oké nri-anyasi nke Chineke;

18 ka unu we rie anu-aru ndi-eze, na anu-aru ndi-ọchi-agha, na anu-aru ndi di ike, na anu-aru inyinya na nke ndi nānọkwasi ha, na anu-aru madu nile, ma ndi nwere onwe-ha ma ndi-orù, ma ndi ntà ma ndi uku.

19 M’we hu anu-ọhia ahu, na ndi-eze uwa, na usu nile nke ndi-agha-ha, ka ha zukọrọri ibu agha megide Onye ahu Nke nānọkwasi inyinya ahu, megide kwa usu-ndi-agha-Ya.

20 Ewe jide anu-ọhia ahu, ya na onye-amuma ugha ahu nke nēme ihe-iriba-ama ahu n’iru ya, bú nke o ji duhie ndi natarari akàrà nke anu-ọhia ahu, na ndi nākpọ isi ala nye ihe-oyiyi-ya: ewe tubà ha abua na ndu nime ọdọ ọku ahu nke ji brimstone nēre:

21 ewe were mma-agha nke Onye ahu nānọkwasi n’inyinya ahu, bú mma-agha ahu nke si n’ọnu-Ya puta, b͕ue ndi fọduru: nnunu nile we rijuru afọ site n’anu-aru-ha.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 20

1 M’we hu mọ-ozi ka o nēsi n’elu-igwe ridata, nēji nkpisi-ugodi nke abyss ahu n’aka-ya, ya na oké nkpọrọ.

2 O we jide dragon ahu, bú agwọ ochie ahu, onye bu Ekwensu na Setan, o we ke ya ab͕u nnù arọ abua na ọgu iri,

3 we tubà ya nime abyss ahu, mechie ya, kà kwa ya akàrà n’elu ya, ka o we ghara iduhie mba nile ọzọ, rue mb͕e nnù arọ abua na ọgu iri ahu gāgwusi: mb͕e arọ ndia gasiri aghaghi itọpu ya nwa oge.

4 M’we hu oche-eze, ha we nọkwasi ha, we nye ha ikpé: m’we hu nkpuru-obi nke ndi ebipururi isi n’ihi àmà Jisus, na n’ihi okwu Chineke, ndi ahu nọ kwa, bú ndi nākpọghi isi ala nye anu-ọhia ahu, ma-ọbu ihe-oyiyi-ya, ndi nānataghi kwa akàrà-ya n’egedege-iru-ha na n’aka-ha; ha we di ndu, so kwa Kraist buru eze nnù arọ abua na ọgu iri.

5 Ndi fọduru n’etiti ndi nwuru anwu adighi ndu rue mb͕e nnù arọ abua na ọgu iri ahu gāgwusi. Nka bu nbilite-n’ọnwu mbu.

6 Ngọzi nādiri ya, ọ di kwa nsọ, bú onye nwere òkè nime nbilite-n’ọnwu mbu ahu: ọnwu nke-abua ahu enweghi ike n’ebe ndia nọ; kama ha gābu ndi-nchu-àjà nke Chineke na nke Kraist, ha gēso kwa Ya buru eze nnù arọ abua na ọgu iri ahu.

7 Ma mb͕e nnù arọ abua na ọgu iri ahu gāgwusi, agātọpu Setan n’ulo-nkpọrọ-ya,

8 ọ gāputa kwa iduhie mba nile ndi di na nkuku anọ nke uwa, bú Gog na Megog, ime ka ha zukọ ibu agha ahu: ndi ọnu-ọgugu-ha ra ka ájá nke oké osimiri.

9 Ha we rigo n’obodobo uwa, nọgide ọmuma-ulo-ikwū ndi nsọ gburugburu, ya na obodo ahu nke ahuworo n’anya: ọku we si n’elu-igwe ridata, ripia ha.

10 Ekwensu ahu nke nēduhie ha, atubàra ya nime ọdọ ọku na brimstone, ebe anu-ọhia ahu na onye-amuma ugha ahu nọ kwa; agēmekpa kwa ha aru ehihie na abali rue mb͕e nile ebighi-ebi.

11 M’we hu oké oche-eze di ọcha, na Onye nānọkwasi ya, Onye uwa na elu-igwe b͕apuru n’iru Ya; ahughi kwa ebe ọ bula nye ha.

12 M’we hu ndi nwuru anwu nile, ndi uku na ndi ntà, ka ha nēguzo n’iru oche-eze ahu; ewe saghe akwukwọ di iche iche: asaghe-kwa-ra akwukwọ ọzọ, nke bu akwukwọ nke ndu: ewe kpe ndi nwuru anwu ikpé site n’ihe nile edereri n’akwukwọ ahu di iche iche, dika ọlu nile ha si di.

13 Oké osimiri we nyeghachi ndi nwuru anwu di nime ya; ọnwu na Hedis nyeghachi-kwa-ra ndi nwuru anwu di nime ha: ewe kpe ha ikpé n’otù n’otù dika ọlu nile ha si di.

14 Ewe tubà ọnwu na Hedis nime ọdọ ọku ahu. Nka bu ọnwu nke-abua ahu, bú ọdọ ọku ahu.

15 Ọ buru kwa na ahughi onye ọ bula ka edereri aha-ya n’akwukwọ nke ndu ahu, ewe tubà ya n’ọdọ ọku ahu.