Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 1

1 Nkpughe nke Jisus Kraist, nke Chineke nyere Ya igosi ndi-orù-Ya, bú ihe nāghaghi iputa n’isi nso: O we site n’aka mọ-ozi-Ya ziga we gosi Jọn orù-Ya;

2 onye b͕ara àmà nke okwu Chineke, na nke àmà Jisus Kraist, ka ha ra, bú ihe ọ huru.

3 Ngọzi nādiri onye nāgu, na ndi nānu okwu nile nke amuma nka, ndi nēdebe kwa ihe nile edeworo nime ya: n’ihi na oge ahu di nso.

4 Jọn nēdegara nzukọ Kraist asa nke di n’Esia akwukwọ: Amara diri unu, ya na udo, nke si n’aka Onye ahu puta, bú Onye nādi adi, Onye dikwari, Onye nābia kwa; nke si kwa n’aka Mọ asa ahu puta, bú ndi nọ n’iru oche-eze-Ya;

5 nke si kwa n’aka Jisus Kraist puta, Onye bu onye-àmà kwesiri ntukwasi-obi, onye eburu uzọ mu n’etiti ndi nwuru anwu, buru kwa onye-isi nke ndi-eze uwa. Onye ahu Nke nāhu ayi n’anya, Onye tọpu-kwa-ra ayi na nmehie nile ayi nime ọbara-Ya;

6 O we me ka ayi buru ala-eze, ndi-nchu-àjà nye Chineke na Nna nke Ya; ọ bu Ya ka otuto nile na ike nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

7 Le, Ọ nābia, Ya na igwe-oji; anya nile ọ bula gāhuzu kwa Ya, ndi ahu gāhu kwa Ya, bú ndi mara Ya ube; ebo nile nke uwa gēti-kwa-ra ya aka n’obi. E, Amen.

8 Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, ka Onye-nwe-ayi Chineke kwuru, bú Onye nādi adi, Onye di-kwa-ri, Onye nābia kwa, Onye puru ime ihe nile.

9 Mu onwem, bú Jọn, nwa-nna-unu na onye nēso unu nwekọ nkpab͕u na ala-eze na ntachi-obi nke di nime Jisus, emere ka m’nọ n’agwe-etiti ahu nke anākpọ Patmọs, n’ihi okwu Chineke na àmà Jisus.

10 Emere ka m’nọ nime Mọ Nsọ n’ubọchi Onye-nwe-ayi, m’we nu otù oké olu n’azum, dika nke opì,

11 ka ọ nāsi, Ihe i nele anya, de ya n’akwukwọ, ziga-kwa-ra nzukọ Kraist asa ndia; zigara Efesọs, ziga-kwa-ra Smuana, ziga-kwa-ra Pagamọm, ziga-kwa-ra Taiataira, ziga-kwa-ra Sadis, ziga-kwa-ra Filadelfia, ziga-kwa-ra Leọdisia.

12 M’we chigharia ile olu ahu nke nākpayerem uka. Mb͕e m’chigharisiri m’we hu ihe-idọba-oriọna asa nke eji ọla-edo me;

13 n’etiti ihe-idọba-oriọna asa ahu ahu-kwa-ram otù Onye yiri nwa nke madu, Onye nēyi uwe nke ruru n’ukwu ala, ewerewo kwa ihe-ọkiké nke ọla-edo ke n’obi-Ya gburugburu.

14 Isi-Ya na agiri-isi-Ya di kwa ọcha dika aji-anu ọcha, dika snow; anya-Ya abua di kwa ka ire ọku;

15 ukwu-Ya abua di kwa ka ọla akwọchapuru ka o b͕upu, dika agāsi na erere ya-ri n’oké ọku; olu-Ya di kwa ka olu ọtutu miri.

16 O nwe-kwa-ra kpakpando asa n’aka-nri-Ya: mma-agha di nkọ nke nwere iru abua nēsi kwa n’ọnu-Ya puta: iru-Ya di kwa ka anyanwu nāmu n’ike-ya.

17 Mb͕e m’huru Ya, m’we da n’ala n’ukwu-Ya dika onye nwuru anwu. O we bikwasim aka-nri-Ya, si, Atula egwu; Mu onwem bu onye mbu na onye ikpe-azu,

18 buru kwa Onye ahu nādi ndu; aghọ-kwa-ram onye nwuru anwu, ma le, anamadi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, enwe-kwa-ram nkpisi-ugodi nile nke ọnwu na nke Hedis

19 Ya mere, de ihe nile i huru n’akwukwọ, ha na ihe nke nādi adi, na ihe nile nke gaje iputa mb͕e ihe ndia gasiri;

20 ihe-omimi nke kpakpando asa ahu nke i huru n’aka-nrim, na ihe-idọba-oriọna asa ahu nke eji ọla-edo me. Kpakpando asa ahu bu ndi-mọ-ozi nke nzukọ Kraist asa ahu: ihe-idọba-oriọna asa ahu bu kwa nzukọ Kraist asa.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 2

1 Degara mọ-ozi nke nzukọ Kraist di n’Efesọs akwukwọ, si,

Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye nēji kpakpando asa ahu n’aka-nri-Ya, Onye nējeghari n’etiti ihe-idọba-oriọna asa ahu nke eji ọla-edo me:

2 Amataram ọlu-gi nile, na ndọb͕u i nādọb͕u onwe-gi n’ọlu, na ntachi-obi-gi, mata kwa na i pughi inagide ndi ọjọ, i nwa-kwa-ra ndi nākpọ onwe-ha ndi-ozi, ma ha abughi, i we hu na ha bu ndi-ugha;

3 i nwe-kwa-ra ntachi-obi, i bū-kwa-ra ibu n’ihi aham, ike akāgwughi kwa gi.

4 Ma enwerem nka imegide gi, na i rapuru ihu-n’anya ahu i nwere na mbu.

5 Ya mere cheta ebe i siworo dapu, gi chèghari kwa, lu kwa ọlu mbu; ma asi na i meghi otú a anamabiakute gi, M’gēwepu kwa ihe-idọba-oriọna-gi n’ọnọdu-ya, ma asi na i chègharighi.

6 Otú ọ di, nka ka i nwere, na i nākpọ ọlu nile nke ndi-Nikọlaitan asì, bú nke Mu onwem nākpọ kwa asì.

7 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, ya ka M’gēkweye ka o rie nkpuru si n’osisi nke ndu ahu puta, bú nke di na Paradais nke Chineke.

8 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Smuana akwukwọ, si,

Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye ahu nke bu onye mbu na onye ikpe-azu, Onye ghọrọ onye nwuru anwu, we dikwa ndu:

9 Amataram nkpab͕u-gi, na ob͕eye i bu (ma i bu ọgaranya), na nkwulu Chineke nke ndi nāsi na ha bu ndi-Ju, ma ha abughi, kama ha bu ulo-nzukọ Setan.

10 Atula ahuhu nile i gaje ihu egwu: le, ekwensu gaje itubà ufọdu n’etiti unu nime ulo-nkpọrọ, ka ewe nwa unu; unu gēnwe kwa nkpab͕u ubọchi iri. Gosi onwe-gi onye kwesiri ntukwasi-obi rue ọnwu, M’gēnye kwa gi okpu-eze ahu, bú ndu.

11 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, agaghi-emejọ ya site n’ọnwu nke-abua ahu.

12 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Pagamọm akwukwọ, si,

Ihe ndi ka O nēkwu, bú Onye ahu Nke nwere mma-agha di nkọ ahu nke nwere iru abua:

13 Amataram ebe i bi, bú ebe oche-eze Setan di: i nējidesi kwa aham ike, i gọnarighi kwa okwukwem, ọbuná n’ubọchi Antipas onye-àmàm, onye nkem kwesiri ntukwasi-obi, onye eb͕uru n’etiti unu, ebe Setan bi.

14 Ma enwerem ihe ole-na-ole imegide gi, n’ihi na i nwere n’ebe ahu ufọdu ndi nējidesi ozizí Belam ike, bú onye nēzí Belak itọb͕ọ n’iru umu Israel ihe-ima-n’ọnyà, ka ha rie ihe achuru n’àjà nye arusi, ka ha kwa kwa iko.

15 Otú a, gi onwe-gi nwe-kwa-ra ufọdu ndi nējidesi ozizí ndi-Nikọlaitan ike otú ahu.

16 Ya mere, chègharia; ma asi na i meghi otú a anamabiakute gi ọsọsọ, M’gēwere kwa mma-agha nke ọnum bu agha megide ha.

17 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, ya ka M’gēnye ufọdu nime manna ahu nke ezobeworo, M’gēnye kwa ya nkume ọcha, n’elu nkume ahu ka edewo-kwa-ra aha ọhu, nke ọ nādighi onye ọ bula matara ma-ọbughi onye nānata ya.

18 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Taiataira akwukwọ, si,

Ihe ndia ka Ọkpara Chineke nēkwu, Onye anya-Ya abua di ka ire ọku, ukwu-Ya abua di kwa ka ọla akwọchapuru ka o b͕upu:

19 Amataram ọlu-gi nile, na ihu-n’anya-gi na okwukwe-gi na ije-ozi-gi na ntachi-obi-gi, mata kwa na ọlu ikpe-azu gi kariri nke-mbu.

20 Ma enwerem nka imegide gi, na i kwere nwanyi ahu, bú Jezebel, onye nākpọ onwe-ya onye-amuma-nwanyi; o nēzí kwa ndi-orùm ihe, nēduhie kwa ha, ka ha kwa iko, ri kwa ihe achuru n’àjà nye arusi.

21 Enye-kwa-ram ya oge, ka o we chègharia; ma ọ chọghi ichèghari n’ikwa-iko-ya.

22 Le, anamatubà ya n’ihe-nkpab͕u, tubà kwa ndi soro ya kwa iko nime oké nkpab͕u, ma asi na ha echègharighi n’ọlu-ya.

23 M’gēwere kwa ọnwu b͕ue umu-ya; nzukọ Kraist nile gāmara kwa na Mu onwem bu onye nēnyocha akuru na obi nile: M’gēnye kwa unu n’otù n’otù dika ọlu nile unu si di.

24 Ma unu ka m’nāgwa, bú ndi fọduru na Taiataira, ka unu ra, bú ndi nēnweghi ozizí a, madu ndi nāmaghi ihe nile di omimi nke Setan, dika ha nēkwu; ebokwasighi m unu ibu arọ́ ọzọ.

25 Otú ọ di, ihe unu nwere, jidesienu ya ike rue mb͕e M’gābia.

26 Onye nēmeri emeri, na onye nēdebe ọlum nile rue ọgwugwu ihe nile, ya ka M’gēnye kwa ike ichi mba nile:

27 ọ gewere kwa nkpa-n’aka ígwè zùa ha dika aturu, dika anākujisi ite nke ọkpu-ite; dika Mu onwem natawokwara n’aka Nnam:

28 M’gēnye kwa ya kpakpando ututu.

29 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 3

1 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Sadis akwukwọ, si,

Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye nwere Mọ asa ahu nke Chineke, na kpakpando asa ahu: Amataram, ọlu-gi nile, na i nwere aha na i di ndu, ma i bu onye nwuru anwu.

2 Ghọ onye nēche nche, me kwa ka ihe fọduru guzosie ike, bú nke gaje inwu anwu: n’ihi na ọ dighi ọlu-gi M’huworo nke zuworo ezù n’iru Chinekem.

3 Ya mere, nēcheta otú i nataworo, ya na otú i nuru; nēdebe kwa ya, chèghari kwa. Ya mere, asi na i cheghi nche, M’gābia dika onye-ori, i gaghi-amara kwa oge hour M’gābiakwasi gi ma-ọli.

4 Ma i nwere aha ole-na-ole na Sadis ndi nēmerughi uwe-ha: ha gēsokam nējeghari nime uwe ọcha; n’ihi na ha bu ndi kwesiri.

5 Onye nēmeri emeri ka agēb͕okwasi uwe ọcha otú a; M’gaghi-ehichapu kwa aha-ya nime akwukwọ nke ndu nkem ma-ọli, M’gēkwuputa kwa aha-ya n’iru Nnam, na n’iru ndi-mọ-ozi-Ya.

6 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.

7 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Filadelfia akwukwọ, si,

Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye di Nsọ, Onye-ezi-okwu, Onye nwere nkpisi-ugodi nke Devid, Onye nēmeghe, ọ dighi kwa onye ọ bula gēmechi, Onye nēmechi kwa, ọ dighi kwa onye ọ bula nēmeghe:

8 Amataram ọlu-gi nile (le, enyewom gi ọnu-uzọ nke emegheworo n’iru gi, nke onye ọ bula nāpughi imechi), na i nwere ike ntà, i debe-kwa-ra okwum, i gọnarighi kwa aham.

9 Le, anamenye ufọdu nime ulo-nzukọ, ahu nke Setan, nime ndi si na ha bu ndi-Ju, ma ha abughi, kama ha nēkwu okwu-ugha; le, M’gēme ka ha bia kpọ isi ala n’iru ukwu-gi, ka ha mara kwa na Mu onwem huru gi n’anya.

10 N’ihi na i debere okwu nke ntachi-obim, Mu onwem gēdebe kwa gi ka i ghara ibà n’oge hour nke ọnwunwa ahu, bú oge hour nke gaje ibiakwasi elu-uwa dum madu bi, inwa ndi bi n’elu uwa.

11 Anamabia ọsọsọ: jidesie ihe i nwere ike, ka onye ọ bula ghara inara ọkpu-eze-gi.

12 Onye nēmeri emeri, ya ka M’gēme ka ọ buru ide n’ulo nsọ nke Chinekem, ọ gaghi-esi kwa n’ebe ahu pua ọzọ ma-ọli: M’gēde-kwasi kwa ya aha Chinekem, na aha obodo Chinekem, bú Jerusalem ọhu, nke si n’elu-igwe ridata site n’ebe Chinekem nọ, M’gēdekwasi kwa ya aha ọhu nkem.

13 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.

14 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Leọdisia akwukwọ, si,

Ihe ndia ka Amen ahu nēkwu, bú Onye-àmà ahu Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke bu kwa Onye-ezi-okwu, Isi nke ihe nile Chineke kère:

15 Amataram ọlu-gi nile, na i jughi oyi i kpoghi kwa ọku: ọ gādi m nọ̄ nma ma i nāju oyi ma-ọbu na i nēkpo ọku.

16 Otú a, n’ihi na i di ṅaraṅara, i kpoghi kwa ọku i jughi kwa oyi, M’gāb͕ọpu gi n’ọnum.

17 N’ihi na i nāsi, Abum ọgaranya. emewo ka m’buru ọgaranya, ọ dighi kwa ihe ọ bula nākpam; i mataghi kwa na gi onwe-gi bu onye ahu nāhuju anya na onye kwesiri ebere na onye dara ob͕eye na onye kpuru ìsì na onye nāb͕a ọtọ:

18 aduam gi ọdú ka i zuru n’akam ọla-edo nke erechaworo n’ọku, ka i we ghọ ọgaranya; ka i zuru kwa uwe ọcha, ka i we bokwasi onwe-gi, ka ewe ghara ime ka ihere nke ib͕a-ọtọ-gi puta ìhè; ka i zuru kwa ọgwu-anya ite n’anya-gi, ka i we nāhu uzọ.

19 Ka ha ra, bú ndi Mu onwem huru n’anya, anamatu ha nmehie ha n’anya, zí kwa ha ihe site n’inye ha ahuhu: ya mere, nānu ọku n’obi, chèghari kwa.

20 Le, anameguzo n’ọnu-uzọ, nāku kwa aka: ọ buru na onye ọ bula anu olum, meghe kwa uzọ, M’gābakute ya, so kwa ya ri nri-anyasi, ya onwe-ya gēsokwam rie.

21 Onye nēmeri emeri, ya ka M’gēkweye ka o som nọdu ala n’oche-ezem, dika Mu onwem meri-kwa-ra, we so Nnam nọdu ala n’oche-eze-Ya.

22 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 4

1 Mb͕e ihe ndia gasiri m’we hu, ma le, ọnu-uzọ ka o gheworo oghe n’elu-igwe, olu mbu m’nu-kwa-ra, olu dika nke opì nākpayerem uka, otù onye nāsi, Rigota n’ebe a, M’gēgosi kwa gi ihe nile nke nāghaghi iputa mb͕e ihe ndia gasiri.

2 Ngwa ngwa emerem ka m’nọ nime Mọ Nsọ: ma le, edebere oche-eze n’elu-igwe, otù Onye nānọkwasi kwa n’oche-eze ahu;

3 Onye ahu Nke nānọdu ala yiri nkume jasper na sardius ma ọ buru na anēle Ya anya: eke-na-ogwurugwu di kwa oche-eze ahu gburugburu, yiri emerald ma ọ buru na anēle ya anya.

4 Orú oche-eze na anọ di kwa oche-eze ahu gburugburu: m’we hu orú ndi-okenye na anọ ka ha nānọkwasi n’oche-eze ndia, ndi eb͕okwasiworo uwe ọcha; ahu-kwa-ram okpu-eze nke ọla-edo n’isi-ha.

5 Àmùmà na olu na éb͕è-elu-igwe nēsi kwa n’oche-eze ahu puta. Ọwa nke ọku asa nēnwu n’iru oche-eze ahu, nke bu Mọ asa ahu nke Chineke;

6 ihe di kwa n’iru oche-eze ahu dika oké osimiri eji enyo me yiri crystal; ihe anọ nke di ndu nọ kwa n’etiti oche-eze ahu, nọ kwa oche-eze ahu gburugburu, ndi juputara n’anya anya n’iru na azu.

7 Ihe mbu ahu nke di ndu yiri ọdum, ihe nke-abua ahu nke di ndu yi-kwa-ra nwa-ehi, ihe nke-atọ ahu nke di ndu nwe-kwa-ra iru dika nke madu, ihe nke-anọ ahu nke di ndu yi-kwa-ra ugo nēfe efe.

8 Ihe anọ ahu nke di ndu nwe-kwa-ra nkù isi n’otù n’otù, ha juputa-kwa-ra n’anya anya gburugburu, ya na nime: ha adighi-ezu ike ehihie na abali, nāsi, Nsọ, nsọ, nsọ, ka Onye ahu di, bú Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Onye diri, Onye nādi kwa adi, Onye nābia kwa.

9 Mb͕e ọ bula ihe anọ ahu nke di ndu gēnye Onye ahu Nke nānọkwasi n’oche-eze ahu otuto na nsọpuru na ekele, bú Onye nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi,

10 orú ndi-okenye na anọ ahu gāda n’ala n’iru Onye ahu Nke nānọkwasi n’oche-eze ahu, ha gākpọ kwa isi ala nye Ya, bú Onye ahu Nke nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, ha gātudà kwa okpu-eze-ha n’iru oche-eze ahu, nāsi,

11 Gi, Onye-nwe-ayi na Chineke-ayi, I kwesiri inara otuto nile na nsọpuru nile na ike nile: n’ihi na Gi onwe-gi kère ihe nile, ọ bu kwa n’ihi ọchichọ-Gi ka ha diri, ka ekè-kwa-ra ha èkè.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 5

1 M’we hu akwukwọ nke edere ya-ri ihe n’ime na azu, nke eji-kwa-rari akàrà asa kasie ya ike, ka ọ di n’aka-nri Onye ahu Nke nānọkwasi n’oche-eze ahu.

2 M’we hu mọ-ozi di ike, ka o nēwere oké olu nēkwusa, si, Ònye kwesiri isaghe akwukwọ ahu, na inyawapu akàrà-ya?

3 Ọ dighi kwa onye ọ bula di n’elu-igwe, ma-ọbu n’elu uwa, ma-ọbu n’okpuru uwa, puru isaghe akwukwọ ahu, ma-ọbu ile ya anya.

4 M’we kwa ákwá nke-uku, n’ihi na ahughi onye ọ bula kwesiri isaghe akwukwọ ahu, ma-ọbu ile ya anya:

5 otù onye n’etiti ndi-okenye ahu we sim, Akwala ákwá: le, Ọdum ahu Nke si n’ebo Juda puta, Onye bu Nkpọrọgwu nke Devid, O kwesiri, isaghe akwukwọ ahu na akàrà-ya asa.

6 M’we hu Nwa-aturu ka O nēguzo n’etiti oche-eze ahu na ihe anọ ahu nke di ndu, guzo kwa n’etiti ndi-okenye ahu, dika agāsi na eb͕uru Ya-ri, O nwe-kwa-ra mpi asa, na anya asa, nke bu Mọ asa ahu nke Chineke, bú nke ezigaworo ha n’uwa nile.

7 O we bia, Ọ narawo kwa akwukwọ ahu n’aka-nri Onye ahu Nke nānọkwasi n’oche-eze ahu.

8 Mb͕e Ọ natara akwukwọ ahu, ihe anọ ahu nke di ndu na orú ndi-okenye na anọ ahu we da n’ala n’iru Nwa-aturu ahu, ha nile n’otù n’otù nwere ubọ-akwara, na ọkwa nke eji ọla-edo me nke juputara n’ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nke bu ekpere ndi nsọ.

9 Ha nābù kwa abù ọhu, si, I kwesiri inata akwukwọ ahu, na isaghe akàrà-ya: n’ihi na eb͕uru Gi eb͕u, I were kwa ọbara-Gi b͕atara Chineke madu si n’ebo nile ọ bula, na asusu nile ọ bula, na ndi nile ọ bula, na mba nile ọ bula, puta,

10 I we me ha ka ha buru ala-eze na ndi-nchu-àjà nye Chineke-ayi; ha bu kwa eze n’elu uwa.

11 M’we hu, nu kwa olu ọtutu ndi-mọ-ozi ndi nọ oche-eze ahu na ihe anọ ahu nke di ndu na ndi-okenye ahu gburugburu; ọnu-ọgugu-ha riri oké nne nke-uku, nke anāpughi iguta ha;

12 anurum ka ha were oké olu nāsi, O kwesiri, bú Nwa-aturu ahu Nke eb͕uworo eb͕u, inata ike nile, na àkù, na amam-ihe, na ume, na nsọpuru, na otuto, na ngọzi.

13 M’we nu ihe nile ọ bula ekère èkè nke di n’elu-igwe, na n’elu uwa, na n’okpuru uwa, na n’elu oké osimiri, ha na ihe nile di ha nime, ka ha nāsi, Ọ bu Onye ahu Nke nānọkwasi n’oche-eze ahu, Ya na Nwa-aturu ahu, ka ngọzi nile na nsọpuru nile na otuto nile na ike nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi.

14 Ihe anọ nke di ndu we si, Amen. Ndi-okenye ahu we da n’ala we kpọ isi ala.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 6

1 M’we hu mb͕e Nwa-aturu ahu saghere otù nime akàrà asa ahu, m’we nu otù nime ihe anọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, dika agāsi na o ji olu éb͕è-elu-igwe nēkwu, si, Bia.

2 M’we hu, ma le, inyinya ọcha, Onye nānọkwasi ya nwe-kwa-ra uta; ewe nye Ya okpu-eze: O we puta nēmeri, ya na ka O we meri.

3 Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-abua, m’we nu ihe nke-abua ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Bia.

4 Inyinya ọzọ we puta, bú inyinya nke nācha ọku ọku: ewe nye onye nānọkwasi ya ike inapu udo n’uwa, ya na ka ha we b͕urita onwe-ha: ewe nye ya oké mma-agha.

5 Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-atọ, m’we nu ihe nke-atọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Bia. M’we hu, ma le, inyinya oji; onye nānọkwasi ya nwe-kwa-ra ihe-ọtùtù n’aka-ya.

6 M’we nu dika agāsi na ọ bu otu n’etiti ihe anọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Otù ọtùtù ntà nke ọkà bu otù shilling, ọtùtù ntà atọ nke barley bu otù shilling; emejọ-kwa-la manu na manya-vine.

7 Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-anọ, m’we nu olu nke ihe nke-anọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Bia.

8 M’we hu, ma le, inyinya nke aru-ya yiri ozu: onye nānọkwasi kwa ya, aha-ya bu Ọnwu; Hedis we so ya ga. Ewe nye ha ike ichi otù uzọ n’uzọ anọ nke uwa, iji mma-agha, na iji oké unwu, na iji ọnwu, nēb͕u, iwere kwa anu-ọhia nke uwa nēb͕u.

9 Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-ise, m’we hu n’okpuru ebe-ichu-àjà ahu nkpuru-obi nke ndi eb͕ururi n’ihi okwu Chineke, na n’ihi àmà ahu nke ha nwere:

10 ha we were oké olu tie nkpu, si, Rùe ole mb͕e, Onye-nwe-ayi, Onye di nsọ, buru kwa Onye-ezi-okwu, ka I nēkpeghi ikpé bọ̀ kwa ọ́bọ̀ ọbara-ayi n’isi ndi bi n’elu uwa?

11 Ewe nye ha n’otù n’otù uwe-nwuda di ọcha; ewe si ha, ka ha zuru ike nwa oge ọzọ, rue mb͕e ndi-orù-ibe-ha na umu-nna-ha gēzu kwa ezù, bú ndi agaje ib͕u dika eb͕u-kwa-ra ha onwe-ha.

12 M’we hu mb͕e Ọ saghere akàrà nke-isi, oké ala-ọma-jijiji we da; anyanwu we ghọ oji dika ákwà-nkpe nēji nji nke eji aji anu kpa, ewe me ọnwa ka ọ gbaze ka ọbara:

13 kpakpando nile nke elu-igwe we da rue ala, dika osisi fig nātupu nkpuru-ya nāchaghi acha, mb͕e oké ifufe nēfeghari ya.

14 Ewe kewapu elu-igwe dika akwukwọ-odide mb͕e anāpiakọta ya; ewe wepu ugwu nile na agwe-etiti nile ọ bula n’ọnọdu-ha.

15 Ndi-eze nke uwa, na ndi-amadi, na ndi-isi-ọchi-agha, na ndi-ọgaranya, na ndi di ike, na orù ọ bula, na onye ọ bula nwere onwe-ya, we zobe onwe-ha nime ọb͕à na nime oké nkume nke ugwu:

16 ha nāsi kwa ugwu na oké nkume ahu, Dakwasinu ayi, zopu ayi n’iru Onye ahu Nke nānọkwasi n’oche-eze ahu, zopu kwa ayi n’iwe nke Nwa-aturu ahu:

17 n’ihi na oké ubọchi nke iwe-ha abiawo; ònye pu-kwa-ra iguzo?

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 7

1 Mb͕e nka gasiri m’we hu ndi-mọ-ozi anọ ka ha nēguzo n’elu nkuku anọ nke uwa, nējidesi ifufe anọ nke uwa ike, ka ifufe ọ bula we ghara ife n’elu uwa, ma-ọbu n’elu oké osimiri, ma-ọbu n’elu osisi ọ bula.

2 M’we hu mọ-ozi ọzọ ka o nēsi n’ọwuwa-anyanwu rigo, nēnwe akàrà nke Chineke di ndu; o we were oké olu tiere ndi-mọ-ozi anọ ahu nkpu, bú ndi enyere ha ike imejọ uwa na oké osimiri,

3 si, Emejọla uwa, ma-ọbu oké osimiri, ma-ọbu osisi, rue mb͕e ayi gākasiwo ndi-orù Chineke-ayi akàrà n’egedege-iru-ha.

4 M’we nu ọnu-ọgugu ndi akarari, ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ, ndi akarari akàrà site n’ebo nile ọ bula nke umu Israel.

5 Akarari akàrà site n’ebo Juda orú nnù na nnù iri:

Site n’ebo Reuben orú nnù na nnù iri:

Site n’ebo Gad orú nnù na nnù iri:

6 Site n’ebo Asha orú nnù na nnù iri:

Site n’ebo Naftali orú nnù na nnù iri:

Site n’ebo Manase orú nnù na nnù iri:

7 Site n’ebo Simeon orù nnù na nnù iri:

Site n’ebo Livai orú nnù na nnù iri:

Site n’ebo Isaka orú nnù na nnù iri:

8 Site n’ebo Zebulum orú nnù na nnù iri:

Site n’ebo Josef orú nnù na nnù iri:

Site n’ebo Benjamin orú nnù na nnù iri:

9 Mb͕e ihe ndia gasiri m’we hu, ma le, oké ìgwè madu, nke onye ọ bula nāpughi iguta ọnu, ndi si na mba nile ọ bula, na ebo nile, na ndi nile, na asusu nile, puta, nēguzo n’iru oche-eze ahu na n’iru Nwa-aturu ahu, eb͕okwasiworo ha uwe-nwuda di ọcha, igu-nkwu di kwa n’aka-ha;

10 ha we were oké olu tie nkpu, si, Nzọputa diri Chineke-ayi, Onye nānọkwasi n’oche-eze ahu, di-kwa-ra Nwa-aturu ahu.

11 Ndi-mọ-ozi nile nēguzo kwa oche-eze ahu na ndi-okenye ahu na ihe anọ ahu nke di ndu gburugburu; ha we da kpuchie iru-ha n’ala n’iru oche-eze ahu, we kpọ isi ala nye Chineke,

12 si, Amen: Ngọzi nile, na otuto nile, na amam-ihe nile, na ekele nile, na nsọpuru nile, na ike nile, na ume nile, diri Chineke-ayi rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

13 Otù n’etiti ndi-okenye ahu we za, sim, Ndia ndi eb͕okwasiworo uwe-nwuda ahu di ọcha, hà bu ole ndi, òle ebe ha si bia kwa?

14 M’we si ya, Onye-nwem, gi onwe-gi matara. O we sim, Ndia bu ndi nēsi n’oké nkpab͕u ahu puta, ha sa-kwa-ra uwe-nwuda-ha, me kwa ka ha di ọcha nime ọbara Nwa-aturu ahu.

15 N’ihi nka ka ha nọ n’iru oche-eze Chineke; ha nēfè kwa Ya òfùfè ehihie na abali n’ulo nsọ Ya: Onye ahu Nke nānọkwasi n’oche-eze ahu gāb͕asa kwa ulo-ikwū-Ya n’isi-ha.

16 Agu agaghi-agu ha ọzọ, akpiri agaghi-akpọ kwa ha nku ọzọ; anyanwu agaghi-acha kwa ha ọzọ, ma-ọbu okpom-ọku ọ bula:

17 n’ihi na Nwa-aturu ahu Nke nọ n’etiti oche-eze ahu gāzù ha dika aturu, Ọ gēduru kwa ha ga n’isi-iyi nke miri nke ndu: Chineke gēhichapu kwa anya-miri nile ọ bula n’anya-ha.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 8

1 Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-asa, ewe dere ji n’elu-igwe oge ra ka nkera nke otù hour.

2 M’we hu ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nēguzo n’iru Chineke; ewe nye ha opì asa.

3 Mọ-ozi ọzọ we bia guzo n’elu ebe-ichu-àjà ahu, nēnwe ihe nke ọla-edo eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; ewe nye ya ọtutu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ we tukwasi ha n’ekpere ndi nsọ nile nke di n’elu ebe-ichu-àjà ahu nke ọla-edo nke di n’iru oche-eze ahu.

4 Anwuru-ọku nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ ahu soro ekpere ndi nsọ site n’aka mọ-ozi ahu rigo n’iru Chineke.

5 Mọ-ozi ahu we were ihe ahu eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; o we kpojue ya n-ọku nke sitere n’ọku nke ebe-ichu-àjà ahu, we tubà ya n’uwa: éb͕è-elu-igwe, na olu na àmùmà, na ala-ọma-jijiji we so.

6 Ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere opì asa ahu doziri onwe-ha ifù opì.

7 Onye mbu we fùa opì, ákú-miri-ígwé na ọku we so, nke agwarari ọbara, ewe tubà ha n’uwa: ọku we b͕achasia otù uzọ n’uzọ atọ nke uwa, ọku b͕achasi-kwa-ra otù uzọ n’uzọ atọ nke osisi, ọku b͕achasi-kwa-ra ahihia ndu nile.

8 Mọ-ozi nke-abua we fùa opì, ewe tubà ihe dika oké ugwu nke nēre ọku nime oké osimiri: otù uzọ n’uzọ atọ nke oké osimiri we ghọ ọbara;

9 otù uzọ n’uzọ atọ nke ihe nile ekère èkè nke di n’oké osimiri we nwua, bú ihe nwere ndu; emebi-kwa-ra otù uzọ n’uzọ atọ nke ub͕ọ nile.

10 Mọ-ozi nke-atọ we fùa opì, oké kpakpando we site n’elu-igwe da, nke nēre ọku dika ọwa, o we da n’elu otù uzọ n’uzọ atọ nke osimiri nile, da kwa n’elu isi-iyi miri nile;

11 aha anākpọ kwa kpakpando ahu bu Wormwood: otù uzọ n’uzọ atọ nke miri nile we ghọ wormwood; ọtutu madu we site n’iṅu miri ahu nwua, n’ihi na emere ka ha nēlu ilu.

12 Mọ-ozi nke-anọ we fùa opì, ewe tie otù uzọ atọ nke anyanwu ihe, ya na otù uzọ n’uzọ atọ nke ọnwa, na otù uzọ n’uzọ atọ nke kpakpando nile; ka otù uzọ n’uzọ atọ nime ha we b͕a ọchichiri, ka ehihie we ghara kwa iputa ìhè n’otù uzọ n’uzọ atọ nime ya, ka ọchichiri we me kwa otú a.

13 M’we hu, nu kwa otù ugo, ka ọ nēfe n’etiti elu-igwe, were kwa oké olu si, Ahuhu, ahuhu, ahuhu, ka ha gāhu, bú ndi bi n’elu uwa, site n’olu fọduru nke opì ndi-mọ-ozi atọ, ndi gaje ifù opì.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 9

1 Mọ-ozi nke-ise we fùa opì, m’we hu kpakpando nke sitereri n’elu-igwe da n’uwa: ewe nye ya nkpisi-ugodi nke olùlù nke abyss ahu.

2 O we meghe olùlù nke abyss ahu; anwuru-ọku we si n’olùlù ahu kwugo, dika anwuru-ọku nke oké ọku; anyanwu na mbara-elu-igwe we site n’anwuru-ọku nke olùlù ahu b͕a ọchichiri.

3 Igurube we si n’anwuru-ọku ahu puta je n’uwa; ewe nye ha ike, dika akpi nke uwa nwere ike.

4 Ewe gwa ha ka ha ghara imejọ ahihia nke uwa, ma-ọbu ihe ọ bula nwere akwukwọ ndu, ma-ọbu osisi ọ bula, ma ka ha mejọ nání madu, bú ndi ahu nēnweghi akàrà nke Chineke n’egedege-iru-ha.

5 Ewe nye ha ike ka ha ghara ib͕u ha, kama ka ewe mekpa ha aru ọnwa ise: nmekpa-aru-ha di ka nmeka-aru nke akpi, mb͕e ọ bula ọ nāb͕a madu.

6 N’ubọchi ahu madu gāchọ kwa ọnwu, ha agaghi-ahu kwa ya ma-ọli; agu inwu ọnwu gāgu kwa ha, ọnwu we b͕anari ha.

7 Oyiyi igurube ahu yiri inyinya edoziworo ije agha; n’isi-ha ka ha nēkpu ihe dika okpu-eze yiri ọla-edo, iru-ha di kwa ka iru madu.

8 Ha nwe-kwa-ra agiri-isi dika agiri-isi ndinyom, ezé-ha di kwa ka ezé ọdum.

9 Ha nwe-kwa-ra ihe-agha ib͕ochi obi, dika ihe-agha ib͕ochi obi nke ígwè; nkpatu nkù-ha di kwa ka nkpatu nke ub͕ọ-ala, nke ọtutu inyinya nāb͕a ọsọ ije agha.

10 Ha nwe-kwa-ra ọdudù yiri ọdudù akpi, nwe ihe-ọb͕ub͕a; nime ọdudù-ha ike-ha di imejọ madu ọnwa ise.

11 Ha nwere mọ-ozi ahu nke abyss ahu dika eze-ha: aha-ya n’asusu Hibru bu Abadon, n’asusu Grik o nwe-kwa-ra aha Apọlion.

12 Ahuhu mbu agabigawo: le, ahuhu abua ọzọ fọduru ibia, mb͕e ihe ndia gasiri.

13 Mọ-ozi nke-isi we fùa opì, m’we nu otù olu nke si na mpi nke ebe-ichu-àjà ahu eji ọla-edo me puta, bú nke di n’iru Chineke,

14 M’we nu otù onye, ka ọ nāgwa mọ-ozi nke-isi ahu okwu, bú onye nwere opì ahu, si, Tọpu ndi-mọ-ozi anọ ahu ndi ekeworo ab͕u n’osimiri uku Yufretis.

15 Ewe tọpu ndi-mọ-ozi anọ ahu, ndi edoziriri nye oge hour na ubọchi na ọnwa na arọ ahu, ka ha we b͕ue otù uzọ n’uzọ atọ nke madu.

16 Ọnu-ọgugu usu-ndi-agha ahu, nke bu ndi-inyinya, di ọgu million iri: anurum ọnu-ọgugu-ha.

17 Otù a ka m’hu-kwa-ra inyinya ahu n’ọhù ahu, ha na ndi nānọkwasi ha, nēnwe ihe-agha ihe-agha ib͕ochi obi nke yiri ọku na hyacinth na brimstone: isi inyinya ahu di kwa ka isi ọdum; ọku na anwuru-ọku na brimstone nēsi kwa n’ọnu-ha puta.

18 Esitere n’ihe-otiti atọ ndia b͕u otù uzọ n’uzọ atọ nke madu nile, ya bu site n’ọku ahu na anwuru-ọku ahu na brimstone ahu, nke nēsi n’ọnu-ha puta.

19 N’ihi na ike inyinya ahu di n’ọnu-ha, di kwa n’ọdudù-ha: n’ihi na ọdudù-ha yiri agwọ, nwe kwa isi; ha were kwa ha nēmejọ.

20 Ma ndi fọduru n’etiti madu, ndi anēb͕ughi n’ihe-otiti ndia, echègharighi isi n’ọlu nile nke aka-ha puta, ka ha we ghara ikpọ isi ala nye ndi-mọ ọjọ, ha na arusi-ha nke ọla-edo, na nke ọla-ọcha, na nke ọla, na nke nkume, na nke osisi; nke nāpughi ile ihe anya, ma-ọbu inu ihe, ma-ọbu ije ije:

21 ha echègharighi kwa isi n’ib͕u-madu-ha, ma-ọbu n’igwọ-nsi-ha, ma-ọbu n’ikwa-iko-ha, ma-ọbu n’izu-ori-ha, puta.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 10

1 M’we hu mọ-ozi ọzọ di ike, ka ọ nēsi n’elu-igwe ridata, nke eb͕okwasiworo ya igwe-oji dika uwe; eke-na-ogwurugwu ahu di kwa n’isi-ya, iru-ya di kwa ka anyanwu, ukwu-ya abua di kwa ka ide ọku;

2 ọ nējide kwa nwa akwukwọ ntà n’aka-ya, nke asagheworo: o we tukwasi ukwu aka-nri ya n’elu oké osimiri tukwasi kwa ukwu aka-ekpe ya n’elu ala;

3 o we were oké olu tie nkpu, dika ọdum nāb͕ọ uja: mb͕e o tiri nkpu, éb͕è-elu-igwe asa ahu we kwue olu-ha.

4 Ma mb͕e éb͕è-elu-igwe asa ahu kwuru okwu, agajem ide akwukwọ: m’we nu olu si n’elu-igwe da, si Kà ihe éb͕è-elu igwe asa ahu kwuru akàrà, ede-kwa-la ha n’akwukwọ.

5 Mọ-ozi ahu, nke m’huru ka ọ nēguzo n’elu oké osimiri na n’elu ala, we welie aka-nri-ya zó n’elu-igwe,

6 we were Onye ahu Nke nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, bú Onye kère elu-igwe na ihe nile di ya nime, na uwa na ihe nile di ya nime, na oké osimiri na ihe nile di ya nime, ṅu iyi na oge agaghi-adi kwa ọzọ:

7 ma n’ubọchi nke olu mọ-ozi nke-asa ahu, mb͕e ọ gaje ifù opì, agēme kwa ka ihe-omimi nke Chineke zu okè, dika O zìri ozi ọma nye ndi-orù-Ya, bú ndi amuma-Ya.

8 Olu ahu nke m’nuru ka ọ nēsi n’elu-igwe da, anu-kwa-ram ya ọzọ ka ọ nākpayerem uka, si, Je, nara akwukwọ ahu nke asagheworo, bú nke di n’aka mọ-ozi ahu onye nēguzo n’elu oké osimiri na n’elu ala.

9 M’we jekuru mọ-ozi ahu, si ya ka o nyem nwa akwukwọ ntà ahu. O we sim, Nara ya, ripia kwa ya; ọ gēme kwa ka afọ-gi lue ilu, ma n’ọnu-gi ọ gātọ utọ dika manu-aṅu.

10 M’we nara nwa akwukwọ ntà ahu n’aka mọ-ozi ahu, we ripia ya; o we tọ utọ n’ọnum dika manu-aṅu; mb͕e m’ripiasiri ya, ewe me ka afọm lue ilu.

11 Ha nāsikwam, I ghaghi ibu amumá ọzọ bayere ọtutu ndi na ọtutu mba na ọtutu asūsū na ọtutu eze.