Categories
NEHUM

NEHUM 1

1 Ibu eboro Nineve. Akwukwọ ọkù nke Nehum, bú onye Elkosh.

2 Chineke ekworo, Nke nābọ̀ kwa ọ́bọ̀, ka Jehova bu; onye-ọ́bọ̀ ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye-nwe ọnuma; onye-ọ́bọ̀ ka Jehova bu n’aru ndi nēmegide Ya, onye nēdebere ndi-iro-Ya iwe ka Ọ bu.

3 Jehova adighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ di kwa uku n’ike, ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmagh: Jehova, n’oké ikuku na n’oké ifufe ka uzọ-Ya di, igwe-oji bu kwa ájá ukwu-Ya abua.

4 Ọ nābasiri oké osimiri nba ike, me ka ọ ta, ọ bu kwa osimiri nile ka O meworo ka ha takọrọ: Beshan nātalata, ya na Kamel, ihe-opupú nke Lebanon nātalata kwa.

5 Ugwu nile emewo nkpatu site na Ya, ugwu ntà nile ab͕azewo kwa; ala we bulie onwe-ya site n’iru Ya, e, elu-uwa dum madu bi na ndi nile bi nime ya.

6 Ònye gēguzo n’iru oké iwe-Ya? ọ̀ bu kwa onye gēguzosi ike n’idi-ọku nke iwe-Ya? awusiwo ọnuma-Ya dika ọku, akwatuwo kwa oké nkume nile site na Ya.

7 Jehova di nma, Ọ bu ebe ewusiri ike n’ubọchi ahuhu; Ọ bu kwa onye nāma ndi nāgbabà nime Ya.

8 Ma Ọ gēji miri nke nērubiga ókè nke nērubiga erubiga me ka ọnọdu obodo ahu gwusia, ọ bu kwa ndi-iro-Ya ka Ọ gāchubà n’ọchichiri.

9 Gini ka unu nēchè megide Jehova? Ya onwe-ya nēme ka ọ gwusia: nkpab͕u agaghi-ebili nke ub͕ò abua.

10 N’ihi na ọ bu ezie na ha di ka ogwu tuhiri atuhi, buru kwa ndi ṅubigaworo manya ókè dika n’iṅubiga-manya-ókè-ha, ọku gēripia ha dika ahihia-ọka kpọnwusiri akpọnwu.

11 Nime gi ka otù onye siri puta, nke nēchè ihe ọjọ megide Jehova, nādu kwa ọdu ihe jọb͕uru onwe-ya.

12 Otú a ka Jehova siri: Ọ bu ezie na ha zuru okè, ba kwa uba otú a, ọbuná otú a ka agēb͕utu ha, ọ gāgabiga kwa. Ọ bu ezie na ewedawom i n’ala, ma M’agaghi-eweda kwa gi n’ala ọzọ.

13 Ma ub͕u a ka M’gāb͕ajipu nkpọrọ yoke-ya n’olu-gi, ọ bu kwa ab͕u-gi nile ka M’gētibi.

14 Jehova enyewo kwa iwu bayere gi, ka aghara igha kwa nkpuru ọ bula ọzọ nke sitere n’aha-gi: n’ulo chi-gi nile ka M’gēbipu arusi apiri api na arusi awuru awu; M’gēdo ílì-gi; n’ihi na elelìwo gi anya.

15 Le, n’elu ugwu ka ukwu nke onye n’ezisa ozi ọma di, bú onye nēme ka anuru okwu udo! Me ememe-gi nile, gi Juda, Kwughachi nkwa nile i kwere: n’ihi na onye jọb͕uru onwe-ya agaghi-agabiga kwa nime gi ọzọ; ebipusiwo ya.

Categories
NEHUM

NEHUM 2

1 Onye-nchusa arigotawo n’iru-gi: chebe ebe ewusiri ike, che uzọ nche, me ka úkwù-gi sie ike, b͕a ike ume nke-uku.

2 N’ihi na Jehova neme ka nbili-elu nke Jekob lata, dika nbili-elu nke Israel: n’ihi na ndi-nwusi awusiwo ha dika miri, ọ bu kwa ngalaba-vine nile ha ka ha bibiworo.

3 Ọta ndi-dike-ya bu ihe esijiri ọbara-ọbara, ndi-dìnkpà-ya yiri uwe nācha uhie uhie: ígwè nēb͕upu eb͕upu ka ub͕ọ-ala-ya nwere n’ubọchi ndozi-ya, emewo ka osisi fir nile me nkpatu nke-uku.

4 N’èzí nile ka ub͕ọ-ala nile kpọtuworo nkpọtu nke-uku, ha nāb͕aghari iru na azu n’amá nile: ha di ka ọwa nēnwu enwu n’ile ha anya, dika àmùmà ka ha nāb͕a ọsọ.

5 Ọ nēcheta ndi-ebube-ya: ha su ngọngọ n’ojije-ha, me ngwa ijeru mb͕idi obodo, ma edoziwo ihe-nkpuchi ndi nānọchigide ya n’agha.

6 Emeghewo ọnu-uzọ-ama nile nke osimiri nile, ab͕azewo ulo uku ya.

7 Ekpughewo kwa Huzab, me ka ọ rigopu, ndi-orù-ya ndinyom nākwa kwa ákwá dika olu nduru, nēti obi-ha aka.

8 Ma Nineve di ka ọdọ-miri juputara na miri site n’ubọchi nile ya onwe-ya di: ma ndi ahu nāb͕alaga; Guzonu, guzonu, ka ha nāsi; ma ọ dighi onye nāgha anya n’azu.

9 Lutanu ọla-ọcha n’agha lutanu ọla-edo n’agha: ọ dighi kwa ọgwugwu diri àkù edoziri edozi, bú ebube nke sitere n’ihe nile anāchọsi ike.

10 Ọ bu ihe tọb͕ọrọ n’efu, na ihe awusiri dika miri, na ihe ab͕abara ọtọ: obi alọwo kwa miri, isu-ngọngọ nke ikperè abua di kwa, nb͕ali di kwa n’úkwù nile, iru ha nile achagharisiwo kwa.

11 Òle ebe ebe-obibi ọdum di? ebe-ita-nri ka ọ bu-kwa-ra umu-ọdum, ebe ọdum na nne-ọdum na nwa-ọdum jeghariri, ọ dighi kwa onye nēme ka ha ma jijiji.

12 Ọdum nādọb͕u anu gēzuru umu-ya, ọ nātọb͕uta-kwa-ra nne-ọdum-ya nile anu, we kpojue ọb͕à-ya nile n’anu-ndọb͕u, kpoju kwa ebe-obibi-ya nile n’anu ọ dọb͕uworo.

13 Le, Mu nēmegide gi, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M’gēsure kwa ub͕ọ-ala-ya n’anwuru-ọku, ọ bu kwa umu-ọdum-i ka mma-agha gēripia: M’gēbipu kwa anu-ndọb͕u-gi n’uwa, agaghi-anu kwa olu ndi-ozi-gi ọzọ.

Categories
NEHUM

NEHUM 3

1 Ahuhu diri obodo ọbara! o juputasiri n’okwu-ugha na ndọka; ndọb͕u-anu adighi-apu na ya.

2 Ge nti olu utali, na olu nke ùzù wheel; na inyinya nāwuli awuli, na ub͕ọ-ala nāmali amali;

3 na onye-inyinya nēme ka inyinya-ya rigo, na mma-agha nēb͕upu eb͕upu, na ube nēb͕u àmùmà; na ọtutu ndi eb͕uru eb͕u, na oké obo ozu; ọ dighi kwa ọgwugwu diri ozu-ha; ha nāsu ngọngọ n’ozu-ha:

4 n’ihi iba-uba nke ikwa-iko nile nke nwanyi nākwa iko onye mara nma nke-uku, bú nwanyi nwe mb͕asi di iche iche, nke nēre mba di iche iche site n’ikwa-iko-ya nile, na ab͕uru di iche iche site na mb͕asi-ya nile.

5 Le, Mu nēmegide gi, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M’gēkpughe kwa ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi n’iru-gi, me ka mba nile hu ọtọ-gi, na ala-eze nile ka ha hu ihere-gi.

6 M’gātukwasi kwa gi ihe-árú di iche iche, M’gākpọ kwa gi ihe-nzuzu, do gi ka ihe ile anya.

7 O gēru kwa, na ndi nile ndi nāhu gi gāb͕anari gi, si, Ebibiwo Nineve: ònye gēgosi ya ebere o ji n’aru ya? Òle ebe M’gāchọputara gi ndi-nkasi-obi?

8 Ì di nma kari No-amon, nke bi n’etiti osimiri Nail nile, nke miri di ya buruburu; nke ékpè-ya bu oké osimiri, oké osimiri ka mb͕idi-ya sitere?

9 Etiopia bu ume-ya, ya na Ijipt, ọ dighi kwa ọgwugwu diri ya; Put na Lubim buri ndi-iye-aka-gi.

10 Ọbuná obodo ahu ka emere ka ọ je biri n’ala ọzọ, ọ lara na ndọta-n’agha: atupia-kwa-ra umu-ya nāṅu ara n’isi èzí nile: ọ bu kwa ndi di nsọpuru ya ka ha fekwasiri nzà, eke-kwa-ra ndi uku ya nkpọrọ.

11 Gi onwe-gi gāṅubiga kwa manya ókè, i gābu onye zoro ezo; gi onwe-gi gāchọ kwa ebe siri ike, n’ihi onye-iro.

12 Ebe-gi nile ewusiri ike gādi ka osisi fig nwere nkpuru-osisi fig buru uzọ cha: ọ buru na arùru ha arù, ha adabá n’ọnu onye nēri ha.

13 Le, ndi-gi bu ndinyom n’etiti gi; ndi-iro-gi ka emeghepusiworo ọnu-uzọ-ama nile nke ala-gi nye: ọku eripiawo ihe-ntuchi-gi nile.

14 Sere onwe-gi miri nke nnọchigide-n’agha, me ka ebe-gi nile ewusiri ike sie ike: ba n’urọ, zọta ájá, jide ihe eji akpu brick.

15 N’ebe ahu ka ọku gēripia gi; mma-agha gēbipu gi, ọ gēripia gi dika ukpala: me onwe-gi ka i rie nne dika ukpala, me onwe-gi ka i rie nne dika igurube.

16 I mewo ka ndi-ahia-gi ba uba kari kpakpando nke elu-igwe: ukpala enwopuwo iwere-ya, felaga.

17 Ndi-gi ekpubeworo okpu-eze di ka igurube, ndi-ọchi-agha-gi di kwa ka ìgwè igurube, ndi nēbe n’ogige ab͕ara ab͕a n’ubọchi juru oyi, ma mb͕e anyanwu wara ha felaga, amaghi kwa ọnọdu-ha ebe ha nọ.

18 Ndi-ọzùzù-aturu-gi atuwo òrù-ura, gi eze Asiria: ndi-ebube-gi nwere ebe-obibi-ha n’ájá: ndi-gi ab͕asawo n’elu ugwu nile, ọ dighi kwa onye-nchikọta ha nwere.

19 Ọ dighi nbilata nb͕aji ab͕ajiri gi nwere; ntiputa-ọnyá-gi jọrọ njọ: ndi nile ndi nānu ihe-ọnunu bayere gi gākukpo gi aka-ha; n’ihi na ònye ka ihe ọjọ gi nāgabigaghi n’isi-ya mb͕e dum?