Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 11

1 Ndi-isi ndi-Ju we biri na Jerusalem: ndi-Ju fọduru fe-kwa-ra nzà, ime ka otù onye nime madu iri bata ibi na Jerusalem, bú obodo nsọ, ka uzọ iteghete ndi fọduru biri kwa n’obodo ọzọ.

2 Ndi-Ju we gọzie ndikom ahu nile ndi were afọ-ofufo nye onwe-ha ibi na Jerusalem.

3 Ma ndia bu ndi-isi ala ahu anāchi achi ndi biri na Jerusalem: ma n’obodo nile nke Juda ka ndi ọzọ biri, nwoke ọ bula n’ihe-onwunwe-ya n’obodo nile ha, bú Israel, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Netinim, na umu ndi-orù Solomon.

4 Ma na Jerusalem ka ufọdu nime umu Juda na nime umu Benjamin biri. Site n’umu Juda: Ataia nwa Uzaia, nwa Zekaraia, nwa Amaraia, nwa Shefataia, nwa Mahalalel, site n’umu Perez;

5 na Maaseia nwa Beruk, nwa Kọl-hose, nwa Hazaia, nwa Adaia, nwa Joiarib, nwa Zekaraia, nwa onye Shailo.

6 Umu Perez nile ndi bi na Jerusalem di nnù na ọgu atọ na asatọ, ndikom bu dìnkpà.

7 Ndia bu kwa umu Benjamin: Salu nwa Meshulam, nwa Joed, nwa Pedaia, nwa Kolaia, nwa Maaseia, nwa Itiel, nwa Jeshaia.

8 N’iso ya Gabaia, na Salai, na nnù abua na ọgu isi na asatọ.

9 Joel nwa Zikri bu kwa onye nēlekọta ha: Juda nwa Hasenua bu kwa onye nke-abua n’ichi obodo ahu.

10 Site na ndi-nchu-àjà: Jedaia nwa Joiarib, na Jakin,

11 na Seraia nwa Hilkaia, nwa Meshulam, nwa Zedok, nwa Meraiot, nwa Ahaitub, bú onye-ndú ulo Chineke,

12 na umu-nne-ha ndi nēje ozi ulo ahu, nnù abua na orú na abua: na Adaia nwa Jeroham, nwa Pelalia, nwa Amzi, nwa Zekaraia, nwa Pashua, nwa Malkija,

13 na umu-nne-ya, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna, ọgu iri-na-abua na abua: na Amashsai nwa Azarel, nwa Ahzai, nwa Meshilemot, nwa Imea,

14 na umu-nne-ha, bú ndi-dike bu dìnkpà, ọgu isi na asatọ: onye nēlekọta ha bu Zabdiel nwa Hagedolim.

15 Site kwa na ndi Livai: Shemaia nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaia, nwa Buni;

16 na Shabetai, na Jozabad, ndi sitere na ndi-isi ndi Livai, ndi bu ndi-isi nke ije-ozi nke èzí diri ulo Chineke;

17 na Matanaia nwa Maika, nwa Zabdi, nwa Esaf, onye bu isi nāmalite ikele ekele n’ekpere, na Bakbukia, bú onye nke-abua n’umu-nne-ya; na Abda nwa Shamua, nwa Galal, nwa Jedutun.

18 Ndi Livai nile n’obodo nsọ ahu di ọgu iri-na-anọ na anọ.

19 Ọzọ, ndi-ọnu-uzọ-ama, bú Akub, na Talmon, na umu-nne-ha, ndi nēche nche n’ọnu-uzọ-ama nile, di ọgu asatọ na iri na abua.

20 Ma ndi fọduru nke Israel, na nke ndi-nchu-àjà, na nke ndi Livai, nọ n’obodo nile nke Juda, nwoke ọ bula n’ihe-nketa-ya.

21 Ma Netinim bi n’Ofel: Ziha na Gishpa bu kwa ndi-isi Netinim.

22 Ma onye-nlekọta ndi Livai nime Jerusalem bu Uzi nwa Bani, nwa Hashabaia, nwa Matanaia, nwa Maika, sitere n’umu Esaf, bú ndi-ọbù-abù, onye nēle ije-ozi nke ulo Chineke anya.

23 N’ihi na ihe eze nyere n’iwu di bayere ha, òkè kwesiri ntukwasi-obi di-kwa-ra ndi-ọbù-abù, ihe nke ubọchi n’ubọchi-ya.

24 Petahia nwa Meshezabel, onye sitere n’umu Zera nwa Juda, nọ kwa n’aka eze, ikwuru ndi-Ju okwu ọ bula.

25 Ma n’obodo ntà nle n’ọhia-ha, ufọdu nime umu Juda biri na Kiriat-aba na umu-obodo-ya, na nime Dibon na umu-obodo-ya, na nime Jekabzeel na obodo ntà ya;

26 na nime Jeshua, na nime Molada, na nime Bet-pelet;

27 na nime Haza-shual, na nime Bia-sheba na umu-obodo-ya;

28 na nime Ziklag, na nime Mekona, na n’umu-obodo-ya;

29 na n’En-rimon, na nime Zora, na nime Jamut;

30 na Zanoa, na Adulam, na obodo ntà ha, na Lekish na ọhia-ya nile, na Azeka na umu-obodo-ya. Ha we ma ulo-ikwū-ha site na Bia-sheba rue ndagwurugwu Hinom.

31 Umu Benjamin bi-kwa-ra site na Geba ga n’iru, nime Mikmash, na Aija, na Bet-el na umu-obodo-ya;

32 na Anatot, na Nob, na Anania;

33 na Hezoa, na Rema, na Gitaim;

34 na Hadid, na Zeboim, na Nebalat;

35 na Lod, na Ono, bú ndagwurugwu ndi-ọ̀kà.

36 Site kwa na ndi Livai òkè ufọdu nke Juda diri Benjamin.

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 12

1 Ma ndia bu ndi-nchu-aja na ndi Livai ndi soro Zerubabel nwa Shealtiel, na Jeshua, rigota: Seraia, na Jeremaia, na Ezra;

2 na Amaria, na Maluk, na Hatush;

3 na Shekania, na Rehum, na Meremot;

4 na Ido, na Ginetoi, na Abaija;

5 na Mijamin, na Maadia, na Bilga;

6 na Shemaia, na Joiarib, na Jedaia;

7 na Salu, na Amok, na Hilkaia, na Jedaia. Ndia bu ndi-isi nke ndi-nchu-àjà na umu-nne-ha n’ubọchi Jeshua.

8 Ndi Livai kwa: Jeshua, na Binui, na Kadmiel, na Sherebia, na Juda, na Matanaia, bú onye-isi usu ndi nēkele ekele, ya onwe-ya na umu-nne-ya.

9 Bakbukia na Uno, bú umu-nne-ha, nọ kwa na ncherita-iru ha, dika ihe-ndebe nile ha si di.

10 Jeshua we mua Joiakim, Joiakim mua Elaiashib, Elaiashib mua Joiada,

11 Joiada, mua Jonatan, Jonatan mua Jadua.

12 Ma n’ubọchi Joiakim ndi-nchu-àjà di, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna: nke Seraia, Meraia; nke Jeremaia, Hananaia;

13 nke Ezra, Meshulam; nke Amaraia, Jehohanan;

14 nke Meluki, Jonatan; nke Shebania, Josef;

15 nke Harim, Adna; nke Meraiot, Helkaia;

16 nke Ido, Zekaraia; nke Gineton, Meshulam;

17 nke Abaija, Zikri; nke Miniamin, nke Moadia, Piltai;

18 nke Bilga, Shamua; nke Shemaia, Jehonatan;

19 nke Joiarib kwa, Matenai; nke Jedaia, Uzi;

20 nke Salai, Kalai; nke Amok, Iba;

21 nke Hilkaia, Hashabaia; nke Jedaia, Netanel.

22 Edewo ndi-Livai n’akwukwọ n’ubọchi Elaiashib na Joiada na Johanan na Jadua ibu ndi-isi ulo nke ndi bu nna: ndi-nchu-àjà kwa, n’ọbubu-eze Daraiọs, bú onye Peasia.

23 Edewo umu Livai n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi ahu, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna, we rue ubọchi Johanan nwa Elaiashib.

24 Ndi-isi ndi Livai kwa: Hashabaia, na Sherebia, na Jeshua nwa Kadimiel, na umu-nne-ha ndi nọ na ncherita-iru ha, ito Chineke na ikele ekele, dika ihe Devid, bú onye nke Chineke, nyere n’iwu si di, otù ihe-ndebe nēcherita ihe-ndebe ọzọ iru.

25 Matanaia na Bakbukia na Obadia na Meshulam na Talmon na Akub bu ndi-ọnu-uzọ-ama nēdebe ihe-ndebe-ha n’ulo-nchikọbata-ihe nile nke ọnu-uzọ-ama nile.

26 Ndia nọ n’ubọchi Joiakim nwa Jeshua, nwa Jozadak, na n’ubọchi Nehemaia, bú onye nāchi ala, na nke Ezra, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ.

27 Ma n’ira mb͕idi Jerusalem nye Chineke ha chọputara ndi Livai n’ebe-ha nile, ime ka ha biarue Jerusalem, ime ememe nke ira mb͕idi Jerusalem nye Chineke, ọbuná n’iṅuri-ọṅu, na n’ikele-ekele, na n’ibù-abù, n’ájà na une na n’ubọ-akwara.

28 Umu nke ndi-ọbù-abù we chikọta onwe-ha, ọbuná site na buruburu-ala nke di Jerusalem buruburu, site kwa n’obodo ntà nile nke ndi Netofa;

29 site kwa na Bet-gilgal, site kwa n’ọhia nile nke Geba na Azmavet: n’ihi na ndi-ọbù-abù wuru obodo ntà nye onwe-ha buruburu Jerusalem.

30 Ndi-nchu-àjà na ndi Livai we me onwe-ha ka ha di ọcha: ha me-kwa-ra ka ndi Israel na ọnu-uzọ-ama nile na mb͕idi di ọcha.

31 M’we me ka ndi-isi Juda rigo n’elu mb͕idi, m’we guzo oké usu abua nke ndi nēkele ekele nēje kwa n’usoro; otù usu we je n’aka-nri n’elu mb͕idi rue ọnu-uzọ-ama nke ebe ikpofu ahihia:

32 Hoshaia we jeso ha, ya na nkera ndi-isi Juda,

33 na Azaraia, na Ezra, na Meshulam,

34 na Juda, na Benjamin, na Shemaia, na Jeremaia,

35 na ufọdu nime umu nke ndi-nchu-àjà, ndi chiri opì: na Zekarai nwa Jonatan, nwa Shemaia, nwa Matanaia, nwa Maikaia, nwa Zakua, nwa Esaf;

36 na umu-nne-ya, bú Shemaia, na Azarel, na Milalai, na Gilalai, na Maai, na Netanel, na Juda, na Hanani, ndi chiri ihe abù nke Devid, bú onye nke Chineke; Ezra, bú ode-akwukwọ, nọ kwa n’iru ha:

37 ha we rigo n’akuku ọnu-uzọ-ama isi-iyi, na ncherita-iru ha kwa, n’elu ihe-nrigo obodo Devid, nime nrigo mb͕idi, site n’akuku di n’elu n’ebe ulo Devid di, we rue ọnu-uzọ-ama miri n’akuku ọwuwa-anyanwu.

38 Usu nke-abua nke ndi nēkele ekele nke nēje izute ha je-kwa-ra, mu onwem so-kwa-ra ha je, mu na nkera ndi-ayi, n’elu mb͕idi, site n’akuku di n’elu n’ebe ulo-elu nke ite-ọku uku di, we rue mb͕idi sara mbara;

39 site kwa n’akuku di n’elu n’ebe ọnu-uzọ-ama Efraim di, na n’akuku ọnu-uzọ-ama ochie, na n’akuku ọnu-uzọ-ama azù, na ulo-elu Hananel, na ulo-elu Hamea, we rue ọnu-uzọ-ama aturu: ha we guzo n’ọnu-uzọ-ama ulo-nche.

40 Usu abua ahu nke ndi nēkele ekele we guzo n’ulo Chineke, ha na mu onwem, nkera ndi nọchiri anya eze nọye-kwa-ram:

41 ndi-nchu-àjà, bú Elaiakim, na Maaseia, na Miniamin, na Maikaia, na Elioenai, na Zekaraia, na Hananaia, guzo-kwa-ra chiri opì;

42 na Maaseia, na Shemaia, na Eleeza, na Uzi, na Jehohanan, na Malkija, na Ilam, na Eza. Ndi-ọbù-abù na Jezrahia, bú onye-nlekọta-ha, we me ka anu olu-ha.

43 Ha we chua àjà uku n’ubọchi ahu, we ṅuria; n’ihi na Chineke mere ka ha ṅuria ọṅu uku; ọzọ kwa, ndinyom-ha na umu-ntakiri-ha ṅuriri: ewe nu ọṅù Jerusalem rue ebe di anya.

44 Ewe me ndikom ufọdu n’ubọchi ahu ka ha buru ndi nēlekọta ime-ulo nile nke idebe àkù, na idebe àjà-nbuli nile, na ibede nkpuru mbu, na idebe otù uzọ n’uzọ iri nile, ichikọbata nime ha, dika ubi obodo nile si di, òkè nile nke iwu nyere ndi-nchu-àjà na ndi Livai: n’ihi na ọṅù Juda di n’ihi ndi-nchu-àjà na n’ihi ndi Livai, bú ndi nēguzo eguzo.

45 Ha we debe ihe-ndebe Chineke-ha, na ihe-ndebe ime-ka-adi-ọcha ahu, ha na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama, dika ihe Devid na Solomon nwa-ya nyere n’iwu si di.

46 N’ihi na n’ubọchi Devid na Esaf site na mb͕e ochie onye-isi nke ndi-ọbù-abù di, na abù otuto na ikele-ekele nke anābùku Chineke.

47 Israel nile n’ubọchi Zerubabel, na n’ubọchi Nehemaia, nēnye kwa òkè nke ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama, ihe nke ubọchi n’ubọchi-ya: ha nēdo-kwa-ra ndi Livai ihe nsọ; ndi Livai nēdo-kwa-ra umu Eron ihe nsọ.

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 13

1 N’ubọchi ahu ka ha guru n’akwukwọ Moses na nti ndi Israel; ewe hu ihe edeworo nime ya, bú na onye Amon na onye Moab agaghi-abà na nkpọkọta ndi Chineke rue mb͕e ebighi-ebi;

2 n’ihi na ha ejighi achicha na miri bia n’iru umu Israel, kama ha gotara Belam imegide ha, ikọcha ha: ma Chineke-ayi b͕anwere nkọcha ahu ka ọ ghọ ngọzi.

3 O rue, mb͕e ha nuru iwu ahu, na ha kewapuru ndi nile gwara ọgwa n’Israel.

4 Ma tutu ihe a eme, Elaiashib, bú onye-nchu-àjà, onye edoro onye-isi ime-ulo nke ulo Chineke-ayi, ebe ọ bu ọgọ Tobaia,

5 ọ we doziere ya ime-ulo uku, ma n’ebe ahu ka ha nētiye na mb͕e gara aga onyinye-inata-iru-ọma, na frankincense, na ihe ulo Chineke nile, na otù uzọ n’uzọ iri nke ọka na manya-vine ọhu na manu, bú ihe enyere n’iwu nke ndi Livai na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama; na àjà-nbuli nke ndi-nchu-aja.

6 Ma na mb͕e a nile anọghm na Jerusalem; n’ihi na n’arọ nke-orú-na-iri-na-abua nke Atakasakses, bú eze Babilon, ka m’biakutere eze, ma n’ọgwugwu ubọchi ufọdu ariọrọm eze ka ọ rapum:

7 m’we biarue Jerusalem, ghọta ihe ọjọ ahu nke Elaiashib mere bayere Tobaia, n’idoziri ya ime-ulo n’ogige ulo Chineke.

8 O we dim njọ nke-uku: m’we si n’ime-ulo ahu tupu ihe nile nke ulo Tobaia n’èzí.

9 M’we kwue, ha we me ka ime-ulo nile di ọcha: m’we chighachi n’ebe ahu ihe ulo Chineke, ha na onyinye-inata-iru-ọma na frankincense.

10 M’we mata na enyeghi òkè ndi Livai enye; ndi Livai na ndi-ọbù-abù, bú ndi nēje ozi ahu, we b͕alaga, nwoke ọ bula n’ubi-ya.

11 Mu na ndi nọchiri anya eze we se okwu, m’we si, Gini mere arapuworo ulo Chineke? M’we chikọta ha, guzo ha n’ebe-nguzo-ha.

12 Juda nile we webata otù uzọ n’uzọ iri nke ọka na manya-vine ọhu na manu n’ulo-àkù.

13 M’we me ndi-ulo-àkù ndi gāchi ulo-àkù nile, bú Shelemaia onye-nchu-àjà, na Zedok, bú ode-akwukwọ, na Pedaia, onye sitere na ndi Livai: Hanan nwa Zakua, nwa Matanaia, nọ kwa n’akuku ha: n’ihi na aguru ha na ndi kwesiri ntukwasi-obi, ọlu-ha bu kwa ikère umu-nne-ha òkè.

14 Chinekem, chetam n’ihi nka, ehichapu-kwa-la omume-eberem nile nke m’meworo n’ulo Chinekem, na n’ihe-ndebe-ya nile.

15 Na mb͕e ahu ka m’huru nime Juda ufọdu ndi nāzọcha ebe-nzọcha-nkpuru-vine n’ubọchi-izu-ike, ndi nēbubata kwa obo ọka, nēbo kwa inyinya-ibu; ọzọ kwa, manya-vine, na nkpuru-vine, na fig, na ibu nile ọ bula, ha nēbubata kwa ha nime Jerusalem n’ubọchi-izu-ike: m’we b͕a àmà megide ha n’ubọchi ha nēre ihe-oriri.

16 Ndi Taia bi-kwa-ra nime ya, ndi nēwebata azù, na ihe nile ọ bula anēre ere, ha nērenye kwa ha umu Juda n’ubọchi-izu-ike, na nime Jerusalem.

17 Mu na ndi amara aha-ha nime Juda we se okwu, m’we si ha, Gini bu ihe ọjọ a nke unu onwe-unu nēme, nēme kwa ubọchi-izu-ike ka ọ ghara idi nsọ?

18 Ọ̀ bughi otú a ka nna-unu-hà mere, Chineke-ayi we me ka ihe ọjọ a nile biakwasi ayi, biakwasi kwa obodo a? ma unu onwe-unu nātukwasi ihe n’ihe di ọku di n’aru Israel, n’ime ubọchi-izu-ike ka ọ ghara idi nsọ.

19 O rue, mb͕e ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem nāb͕a ọchichiri tutu ubọchi-izu-ike erue, na asirim ka emechie uzọ nile, m’si kwa ka aghara imeghe ha rue mb͕e ubọchi-izu-ike gasiri: m’we guzo ufọdu nime ndi nējerem ozi n’ọnu-uzọ-ama, ka aghara ibubata ibu nime n’ubọchi-izu-ike.

20 Ndi nāzu ahia na ndi nēre ihe ọ bula nke anēre ere we nọ ọnọdu-abali n’azu Jerusalem otù ub͕ò ma-ọbu ub͕ò abua.

21 M’we b͕a àmà megide ha, si ha, Gini mere unu onwe-unu nānọ ọnọdu-abali na ncherita-iru mb͕idi? ọ buru na unu eme ya ọzọ, m’gēseti aka megide unu. Site na mb͕e ahu ha abiaghi n’ubọchi-izu-ike.

22 M’we si ndi Livai ka ha nēme onwe-ha ka ha di ọcha, ka ha nābia kwa nēche ọnu-uzọ-ama nile, ido ubọchi-izu-ike nsọ. Chinekem, cheta-kwa-ram ihe a, me-kwa-ram ebere, dika, iba-uba nke ebere-Gi si di.

23 Ọzọ, na mb͕e ahu ka m’huru ndi-Ju ndi lutara nwunye ndi bu ndinyom Ashdod na ndinyom Amon na ndinyom Moab:

24 umu-ha we nēkwu okwu nkera n’asusu Ashdod, ha amataghi kwa ikwu okwu n’asusu ndi-Ju, kama dika asusu uzọ ndi abua ahu si di.

25 Mu na ha we se okwu, m’we kọcha ha, tie ufọdu nime ha aka, kwopu agiri-isi-ha, me ka ha were Chineke ṅua iyi, si, Unu ewela umu-unu ndinyom nye umu-ha ndikom, unu aluta-kwa-lara umu-unu ndikom, ma-ọbu onwe-unu, umu-ha ndinyom.

26 Ọ̀ bughi n’ihe ndia ka Solomon, bú eze Israel, mehiere? ma n’etiti ọtutu mba ọ dighi eze di ka ya, onye Chineke huru n’anya ka ọ bu kwa, Chineke we me ya eze Israel nile: ọbuná onye ahu ka ndinyom ala ọzọ mere ka o mehie.

27 Ọ̀ bu kwa unu ka ayi gēge nti ime ihe ọjọ uku a nile, imekpu emekpu megide Chineke-ayi n’iluta ndinyom ala ọzọ?

28 Ma otù nime umu-ndikom Joiada nwa Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà, bu di nwa-nwayi Sanbalat onye Horonaim: m’we me ka ọ b͕apu n’ebe m’nọ.

29 Chinekem, cheta ha, n’ihi na ha emewo ka agua ọlu-nchu-àjà, na ọb͕ub͕a-ndu ọlu-nchu-àjà, na nke ndi Livai, n’ihe nādighi nsọ.

30 Eme-kwa-ram ka ha puta n’ebe onye ala ọzọ ọ bula nọ di ọcha, m’we guzoro ndi-nchu-àjà, guzo-kwa-ra ndi Livai, ihe-ndebe, nwoke ọ bula n’ije-ozi-ya;

31 na inara onyinye iji biaru nso, bú nkú, na mb͕e ezubere, na inara nkpuru mbu. Chinekem, chetam, imerem ezi ihe.