Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 1

1 Okwu Nehemaia nwa Hakalaia. O rue, n’ọnwa Kislev, n’arọ nke-orú, na mu onwem nọ na Shushan, bú ulo uku eze.

2 Hanani, bú otù nime umu-nnem, we bia, ya onwe-ya na ndikom ufọdu ndi sitere na Juda; m’we jua ha ajuju bayere ndi-Ju, bú ndi-nb͕apu, nke fọduru site na ndọta-n’agha, na ajuju bayere Jerusalem.

3 Ha we sim, Ndi fọduru, bú ndi fọduru site na ndọta-n’agha n’ebe ahu n’ala ahu anāchi achi nọ n’ọnọdu ọjọ na n’ita-uta: etipúsi-kwa-ra mb͕idi Jerusalem, sure kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile ọku.

4 O rue, mb͕e m’nuru okwu ndia, na anọdurum ala, kwa ákwá, rue újú ubọchi ufọdu; m’we bue ọnu, kpe kwa ekpere n’iru Chineke nke elu-igwe,

5 si, Biko, Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, Chineke uku, Nke di kwa egwu, Onye nēdebere ndi nāhu Ya n’anya nēdebe kwa ihe nile O nyere n’iwu, ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ebere:

6 biko, ka nti-Gi nāṅa nti, ka anya-Gi abua saghe kwa, ka I we ge nti ekpere orù-Gi, nke mu onwem nēkpe n’iru Gi ta, ehihie na abali, bayere umu Israel, bú ndi-orù-Gi, m’nēkwuputa kwa nmehie nile nke umu Israel, nke ayi mehieworo megide Gi: e, mu onwem na ulo nnam emehiewo.

7 Ayi emejọwo Gi nke-uku, ayi edebeghi kwa ihe nile enyere n’iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke I nyere Moses, bú orù-gi, n’iwu.

8 Biko, cheta okwu ahu nke I nyere Moses, bú orù-Gi, n’iwu, si, Asi na unu onwe-unu emekpu emekpu, Mu onwem gēme ka unu b͕asa n’etiti ndi nile:

9 ma asi na unu alaghachikutem, we debe ihe nile M’nyere n’iwu me kwa ha, ọ buru na ndi-unu anāchufu adi na nsọtu elu-igwe, site n’ebe ahu ka M’gāchikọta ha, me ka ha biarue ebe ahu nke M’rọputaworo ime ka aham biri n’ebe ahu.

10 Ma ndia bu orù-Gi na ndi-Gi, ndi I were ike uku Gi, were kwa aka-Gi di ike, b͕aputa.

11 Biko, Onye-nwe-ayi, biko, ka nti-Gi nāṅa nti n’ekpere orù-Gi, na n’ekpere ndi-orù-Gi, ndi ọ nātọ utọ itu egwu aha-Gi: biko, me kwa ka ihe nāgara orù-Gi nke-ọma ta, me ka enwe obi-ebere n’aru ya n’iru nwoke a. (Ma mu onwem buru eze obu-ihe-ọṅuṅu.)

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 2

1 O rue n’ọnwa Nisan, n’arọ nke-orú nke Ataksakses, bú eze, na manya-vine di n’iru ya, m’we buru manya-vine ahu, nye eze. Ma akaghm-ajọ njọ n’obi n’iru ya.

2 Eze we sim, Gini mere iru-gi jọrọ njọ, ma gi onwe-gi adighi-aria ọria? nka abughi ihe ọzọ, ọ bu nání obi jọrọ njọ. M’we tua egwu ri nne nke-uku.

3 M’we si eze, Ka eze di ndu rue mb͕e ebighi-ebi: gini mere irum agaghi-eji jọ njọ, mb͕e obodo ahu, bú ulo nke ílì nnam-hà, bu nkpọnkpọ ebe, eripiawo kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile n’ọku?

4 Eze we sim, Ọ̀ bu gini kwa ka gi onwe-gi nāchọ? M’we kpere Chineke nke elu-igwe.

5 M’we si eze, Ọ buru na ọ di eze nma, ọ buru kwa na orù-gi di nma n’anya-gi, ọ bu ka i zigam na Juda, rue obodo ílì nnam-hà, ka m’we wue ya.

6 Eze we sim, (nwunye eze nānọdu kwa n’akuku ya,) Rùe ole mb͕e ka ije-gi gādi? òle mb͕e ka i gālaghachi kwa? O we di nma n’anya eze, o we zigam; m’we nye ya oge.

7 M’we si eze, Ọ buru na ọ di eze nma, ka enyem akwukwọ-ozi inye ndi nāchi ala n’ofè osimiri, ka ha kwe ka m’gabiga rue mb͕e m’batara Juda;

8 na akwukwọ-ozi inye Esaf, bú onye nēche ogige ọma nke eze nwere, ka ọ nyem osisi ijikọta ọnu-uzọ-ama nile nke ulo uku ahu n’otù nke diri ulo ahu, na ijikọta mb͕idi obodo n’otù, na ijikọta ulo n’otù, bú nke m’gābà nime ya. Eze we nyem, dika ezi aka Chinekem si di n’arum.

9 M’we biakute ndi nāchi ala n’ofè osimiri, m’we nye ha akwukwọ-ozi eze. Ma eze zìri ndi-isi usu-ndi-agha na ndi-inyinya isom je.

10 Sanbalat, bú onye Horonaim, na Tobaia, bú orù, bú onye Amon, we nu ya, o we di ha njọ nke-uku na madu abiawo ichọrọ umu Israel ọdi-nma.

11 M’we bata Jerusalem, nọ n’ebe ahu ubọchi atọ.

12 M’we bilie n’abali, mu onwem na ndikom ole-na-ole sorom; ma egosighm madu ọ bula ihe Chinekem nētiye n’obim imere Jerusalem: ọ dighi kwa anu-ulo di n’ebe m’nọ, ọ bu nání anu-ulo ahu nke m’nānọkwasi ya.

13 M’we si n’ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu pua n’abali, we rue n’iru isi-iyi dragon, ru kwa ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia, we le mb͕idi Jerusalem nile anya, bú nke etipúsiri etipú, ọku eripiawo kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile.

14 M’we gabiga rue ọnu-uzọ-ama isi-iyi, ru kwa ọdọ-miri eze: ọ dighi kwa ebe anu-ulo nke di n’okpurum gāgabiga.

15 M’we nārigo na miri-iyi n’abali, m’we nēle mb͕idi ahu anya; m’we chigharia, ba n’ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu, we laghachi.

16 Ma ndi nọchiri anya eze amaghi ebe m’jere, ma-ọbu ihe mu onwem nēme; egosighkwam ndi-Ju rue ub͕u a, egosighkwam ndi-nchu-àjà, egosighkwam ndi amara aha-ha, egosighkwam ndi nọchiri anya eze, egosighkwam ndi fọduru ndi nēje ozi ahu.

17 M’we si ha, Unu onwe-unu nāhu ọnọdu ọjọ nke ayi onwe-ayi nọ nime ya, na Jerusalem bu nkpọnkpọ ebe, na esure-kwa-ra ọnu-uzọ-ama-ya nile n’ọku: bianu ka ayi wue mb͕idi Jerusalem, ka ayi we ghara ibu kwa ihe-ita-uta ọzọ.

18 M’we gosi ha aka Chineke nke di nma n’arum; na okwu nile nke eze kwa nke ọ gwaram. Ha we si, Ka ayi bilie lua mb͕idi. Ha we me ka aka-ha di ike ime ezi ihe a.

19 Sanbalat, bú onye Horonaim, na Tobaia, bú orù, bú onye Amon, na Geshem, bú onye Arebia, we nu ya, ha we chìa ayi ọchì, leda ayi anya, si, Gini bu ihe a nke unu onwe-unu nēme? ọ̀ bu eze ka unu nānupu isi imegide?

20 M’we zaghachi ha okwu, si ha, Chineke nke elu-igwe, Ya onwe-ya gēme ka ihe gara ayi nke-ọma; ayi onwe-ayi, bú ndi-orù-Ya, gēbili kwa lua mb͕idi: ma unu enweghi òkè, ma-ọbu ọnọdu ziri ezi, ma-ọbu ihe-ncheta, nime Jerusalem.

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 3

1 Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà, we bilie, ya na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, ha we lua ọnu-uzọ-ama aturu; ha onwe-ha doro ya nsọ, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya; ọbuná rue ulo-elu Hamea ka ha doro ya nsọ, rue ulo-elu Hananel.

2 N’akuku ya ka ndikom Jeriko luru. N’akuku ha ka Zakua nwa Imri luru.

3 Ọnu-uzọ-ama azù ka umu Hasenaa luru; ndi ahu jikọtara ya n’otù, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile.

4 N’akuku ha ka Meremot nwa Uraia, nwa Hakoz, mere ka mb͕idi di ike. N’akuku ha ka Meshulam nwa Berekaia, nwa Meshezabel, mere ka mb͕idi di ike. N’akuku ha ka Zedok nwa Beana mere ka mb͕idi di ike.

5 N’akuku ha ka ndi Tekoa mere ka mb͕idi di ike; ma ndi-ha ndi di ebube etiyeghi olu-ha n’òfùfè Onye-nwe-ha.

6 Ọnu-uzọ-ama ochie ka Joiada nwa Pasea na Meshulam nwa Besodeia mere ka ọ di ike; ndi ahu jikọtara ya n’otù, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile.

7 N’akuku ha ka Melataia, bú onye Gibeon, na Jadon, bú onye Meronot, ndikom Gibeon na Mizpa, mere ka mb͕idi di ike rue oche-eze nke onye nāchi ala n’ofè osimiri.

8 N’akuku ya ka Uziel nwa Hahaia, bú ndi-nnucha-ọla, mere ka mb͕idi di ike. N’akuku ya ka Hananaia, bú otù onye nime ndi nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ, mere ka mb͕idi di ike, ha we rapu Jerusalem rue mb͕idi di obosara.

9 N’akuku ha ka Refaia nwa Hua, bú onye-isi nkera ala di Jerusalem buruburu, mere ka mb͕idi di ike.

10 N’akuku ha ka Jedaia nwa Harumaf mere ka mb͕idi di ike, bú na ncherita-iru ulo-ya. N’akuku ya ka Hatush nwa Hashabneia mere ka mb͕idi di ike.

11 Malkija nwa Harim na Hashub nwa Pahat-moab mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, bú ulo-elu nke ite-ọku uku.

12 N’akuku ya ka Shalum nwa Halohesh, bú onye-isi nkera ala di Jerusalem buruburu, mere ka mb͕idi di ike, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom.

13 Ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu ka Hanun na ndi bi na Zanoa mere ka ọ di ike; ndi ahu luru ya, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na nnù cubit mb͕idi abua na ọgu iri rue ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia.

14 Ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia ka Malkija nwa Rikab, bú onye-isi ala di Bet-hakerem buruburu, mere ka ọ di ike; onye ahu luru ya, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile.

15 Ọnu-uzọ-ama isi-iyi ka Shalun nwa Kọl-hoze, bú onye-isi ala di Mizpa buruburu, mere ka ọ di ike; onye ahu luru ya, kpue ya, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na mb͕idi ọdọ-miri Shela, rue ubi eze ab͕ara ogige, ru kwa ihe-nrigo nke nēsi n’obodo Devid rida.

16 N’iso ya ka Nehemaia nwa Azbuk, bú onye-isi nkera ala di Bet-zua buruburu, mere ka mb͕idi di ike, rue na ncherita-iru ílì Devid, ru kwa ọdọ-miri nke emere, ru kwa ulo ndi-dike.

17 N’iso ya ka ndi Livai, Rehum nwa Bani, mere ka mb͕idi di ike. N’akuku ya ka Hashabaia, bú onye-isi nkera ala di Keila buruburu, mere ka mb͕idi diri buruburu-ala-ya ike.

18 N’iso ya ka umu-nne-ha, na Bavai nwa Henadad, bú onye-isi nkera ala di Keila buruburu, mere ka mb͕idi di ike.

19 N’akuku ya ka Eza nwa Jeshua, bú onye-isi Mizpa, mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site na ncherita-iru nrigo ulo-ihe-ekike-agha na nkuku mb͕idi.

20 N’iso ya ka Beruk nwa Zabai nuru ọku n’obi ime iberibe ọzọ atùru atù di ike, site na nkuku mb͕idi rue ọnu-uzọ ulo Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà.

21 N’iso ya ka Meremot nwa Uraia nwa Hakoz mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site n’ọnu-uzọ ulo Elaiashib we rue nsọtu ulo Elaiashib.

22 N’iso ya ka ndi-nchu-àjà, bú ndikom nke Buruburu-ala, mere ka mb͕idi di ike.

23 N’iso ha ka Benjamin na Hashub mere ka mb͕idi di ike na ncherita-iru ulo-ha. N’iso ha ka Azaraia nwa Maaseia nwa Ananaia mere ka mb͕idi di ike n’akuku ulo-ya.

24 N’iso ya ka Binui nwa Henadad mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site n’ulo Azaraia rue nkuku mb͕idi, ọbuná rue ulo-elu nkuku.

25 Palal nwa Uzai mere ka mb͕idi di ike site na ncherita-iru nkuku mb͕idi, na ulo-elu nke nāputa n’ulo di n’elu nke eze, bú nke di nso ogige ulo-nche. N’iso ya ka Pedaia nwa Parosh mere ka mb͕idi di ike.

26 (Ma Netinim nēbi n’Ofel, rue na ncherita-iru ọnu-uzọ-ama miri n’akuku ọwuwa-anyanwu, na ulo-elu nke nāputa aputa.)

27 N’iso ya ka ndi Tekoa mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site na ncherita ulo-elu di uku nke nāputa aputa, we rue mb͕idi Ofel.

28 Site n’elu ọnu-uzọ-ama inyinya ka ndi-nchu-àjà mere ka mb͕idi di ike, nwoke ọ bula na ncherita-iru ulo-ya.

29 N’iso ha ka Zedok nwa Imea mere ka mb͕idi di ike na ncherita-iru ulo-ya. N’iso ya ka Shemaia nwa Shekania, bú onye nēche ọnu-uzọ-ama ọwuwa-anyanwu, mere ka mb͕idi di ike.

30 N’iso ya ka Hananaia nwa Shelemaia, na Hanum, bú nwa nke-isi nke Zalaf, mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike. N’iso ya ka Meshulam nwa Berekaia mere ka mb͕idi di ike na ncherita-iru ime-ulo-ya.

31 N’iso ya ka Malkija, bú otù onye nime ndi-nnucha-ọla, mere ka mb͕idi di ike rue ulo Netinim, na nke ndi nāzu ahia, na ncherita-iru ọnu-uzọ-ama Hamifkad, ru kwa nrigo ulo-elu nkuku.

32 N’etiti nrigo ulo-elu nkuku na ọnu-uzọ-ama aturu ka ndi-nnucha-ọla na ndi nāzu ahia mere ka ọ di ike.

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 4

1 O rue, mb͕e Sanbalat nuru na ayi onwe-ayi nālu mb͕idi, na iwe-ya di ọku, ewe kpasue ya iwe, o we chìa ndi-Ju ọchì.

2 O kwue okwu n’iru umu-nne-ya na usu-ndi-agha Sameria, si, Gini ka ndi-Ju ndia ndi nāta aru nēme? hà gārapuru onwe-ha ihe? hà gāchu àjà? hà gēme ka ọlu-ha gwusia n’otù ubọchi? hà gēsi n’obo ájá me ka nkume di adi ọzọ, ebe nkume ahu nile bu ihe akpọworo ọku?

3 Tobaia, bú onye Amon, nọ kwa n’akuku ya, ọ si, Ọzọ, mb͕idi nke ndi ahu nālu, ọ buru na nkita-ọhia arigo n’elu ya, o gētipú kwa mb͕idi-nkume-ha.

4 Nuru, Chineke-ayi; n’ihi na ayi bu ndi eledaworo anya: Gi me kwa ka ita-uta-ha laghachi n’isi-ha, Gi rara kwa ha nye ibu ihe-nluta-n’agha n’ala ndọta-n’agha:

5 ekpuchi-kwa-la ajọ omume-ha, ekwe-kwa-la ka ehichapu nmehie-ha n’iru Gi: n’ihi na ha akpasuwo Gi iwe n’iru ndi nālu mb͕idi.

6 Ayi we lua mb͕idi ahu; ewe lukọta mb͕idi nile rue nkera idi-elu-ya: n’ihi na ndi-Ju nwere obi ilu ọlu.

7 O rue na, mb͕e Sanbalat na Tobaia na ndi Arebia na ndi Amon na ndi Ashdod nuru na anāluzu mb͕idi Jerusalem nile, na amalitere ituchi ntipú-ya nile, iwe-ha we di ọku nke-uku;

8 ha we kekọta onwe-ha, ha nile n’otù, ibia ibuso Jerusalem agha, na ikpatara ya ihe-njehie.

9 Ayi we kpere Chineke-ayi, guzo ndi-nche megide ha ehihie na abali, n’ihi ha.

10 Juda we si, Ike nke ndi-ibu ebilatawo, ma nkpọnkpọ-ihe riri nne; ayi onwe-ayi apughi kwa ilu mb͕idi.

11 Ndi nākpab͕u ayi we si, Ha agaghi-ama, ha agaghi-ahu kwa, rue mb͕e ayi batara n’etiti ha, b͕ue ha, me ka ije-ozi ahu kwusi.

12 O rue, mb͕e ndi-Ju ndi bi n’akuku ha biara, na ha siri ayi ub͕ò iri site n’ebe ahu nile, Unu gēchigharikute ayi.

13 M’we guzo ndi-ayi n’ebe nile dikarisiri ala nke ebe di nime mb͕idi, n’ebe nile sara mbara, m’we guzo ndi-ayi dika ab͕uru nile ha si di, ha na mma-agha-ha, na ube-ha, na uta-ha.

14 M’we hu, bilie, si ndi amara aha-ha, si kwa ndi nọchiri anya eze, si kwa ndi-ayi fọduru, Unu atula egwu ha: chetanu Onye-nwe-ayi, Nke di uku di kwa egwu, bu-kwa-ranu umu-nne-unu, na umu-unu ndikom, na umu-unu ndinyom, na ndinyom-unu, na ulo-unu, agha.

15 O rue na, mb͕e ndi-iro-ayi nuru na ayi mara ya, na Chineke mebi-kwa-ra ndum-ọdu ha duritara onwe-ha, ayi nile we laghachi na mb͕idi, nwoke ọ bula ije ozi-ya.

16 O rue, site n’ubọchi ahu, na nkera ndi nējerem ozi nālu ọlu n’ije-ozi ahu, ma nkera nime ha nēji ube na ọta na uta na uwe-agha; ndi-isi nọ kwa n’azu ulo Juda nile.

17 Ndi nālu mb͕idi n’elu mb͕idi ahu na ndi nēbu ibu nēbo onwe-ha ibu, nwoke ọ bula nēwere otù aka-ya lu ọlu n’ije-ozi ahu, ma otù aka-ya nēji ihe-agha-ya;

18 ndi nālu mb͕idi kwa, nwoke ọ bula na mma-agha-ya ekeworo n’úkwù-ya nọ, ha we nālu mb͕idi otú a. Onye nāfù opì-ike nọ kwa n’akukum.

19 M’we si ndi amara aha-ha, si kwa ndi nọchiri anya eze, si kwa ndi-ayi fọduru, Ije-ozi a riri nne, sa kwa mbara, ayi onwe-ayi ekewawo n’elu mb͕idi, ayi we nọ n’ebe di anya, otù nwoke n’aru nwa-nne-ya.

20 N’ebe ọ bula unu nuru olu opì-ike, n’ebe ahu ka unu gāchikọta onwe-unu n’ebe ayi nọ; Chineke-ayi gēburu ayi agha.

21 Ayi onwe-ayi we nālu ọlu n’ije-ozi ahu: ma nkera-ha nēji ube site na chi-ọbubọ rue mb͕e kpakpando putara.

22 Ọzọ, na mb͕e ahu m’siri ndi-ayi, Ka nwoke ọ bula na onye nējere ya ozi nọ ọnọdu-abali n’etiti Jerusalem, ka ha we buru ayi ndi-nche n’abali, je kwa ozi n’ehihie.

23 Ma ọ dighi onye ọ bula, ma ọ bu mu onwem, ma-ọbu umu-nnem, ma-ọbu ndi nējerem ozi, ma-ọbu ndikom nche ndi nēsom, ọ dighi onye n’etiti ayi nēyipu uwe-ya, nwoke ọ bula were ihe-agha-ya je miri.

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 5

1 Oké iti-nkpu nke ndi-ayi na ndinyom-ha we di megide umu-nne-ha, bú ndi-Ju.

2 N’ihi na ufọdu di ndi nāsi, Ayi onwe-ayi, na umu-ayi ndikom, na umu-ayi ndinyom, di ọtutu: kwe ka ayi nara ọka, ka ayi we rie ihe, we di ndu.

3 Ufọdu di kwa ndi nāsi, Ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile na ulo-ayi nile ka ayi nēdo n’ibé: kwe ka ayi nara ọka, n’ihi oké unwu a.

4 Ufọdu di kwa ndi nāsi, Ayi ewerewo ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile biri ego itu utu-ala eze.

5 Ma ub͕u a dika anu-aru umu-nne-ayi ka anu-aru-ayi di, dika umu-ha ka umu-ayi di: ma, le, ayi onwe-ayi nāzọda umu-ayi ndikom na umu-ayi ndinyom ime ka ha buru ndi-orù, ufọdu di kwa n’etiti umu-ayi ndinyom ndi azọdaworo azọda: ma ayi enweghi ike nke aka-ayi; ma ndi ọzọ nwe ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile.

6 Iwem we di ọku nke-uku mb͕e m’nuru iti-nkpu-ha na okwu ndia.

7 Obim we duam ọdu, mu na ndi amara aha-ha na ndi nọchiri anya eze we se okwu, m’we si ha, Ọmuru-nwa ka unu onwe-unu nānara, nwoke ọ bula n’aka nwa-nne-ya. M’we nwe nkpọkọta uku megide ha.

8 M’we si ha, Ayi onwe-ayi ab͕aputawo umu-nne-ayi, bú ndi-Ju, ndi erenyere ndi mba ọzọ, dika aka-ayi ruru; ùnu onwe-unu gēre kwa umu-nne-unu, àgērenye kwa ayi ha? Ha we b͕a nkiti, ha ahughi kwa okwu ha gāza.

9 M’we si, Ọ dighi nma, bú ihe a nke unu onwe-unu nēme: ọ̀ bughi n’egwu Chineke ka unu gējeghari, n’ihi ita-uta nke ndi mba ọzọ, bú ndi-iro-ayi?

10 Ọzọ kwa, mu onwem na umu-nnem na ndi nējerem ozi nēbinye ha ego na ọka n’ọmuru-nwa. Biko, ka ayi rapu ọmuru-nwa nka.

11 Biko, burunu uzọ nyeghachi ha ubi nile ha, na ubi-vine nile ha, na ubi-olive nile ha, na ulo nile ha, na otù uzọ n’ọgu uzọ ise nke ego, na nke ọka, na nke manya-vine ọhu, na nke manu, nke unu nānara ha n’ọmuru-nwa.

12 Ha we si, Ayi gēnyeghachi ha, ayi agaghi-achọ kwa ihe n’aka ha; otú a ka ayi gēme, dika gi onwe-gi nēkwu. M’we kpọ ndi-nchu-àjà, me ka ha ṅua iyi ime dika okwu a si di.

13 Arurupu-kwa-ram obi-uwem, si, Ka Chineke rurupu nwoke ọ bula otú a site n’ulo-ya, site kwa na ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n’ọlu, bú onye nādighi-eme ka okwu a guzosie ike; ọbuná otú a ya bu ihe arurupuworo, nke tọb͕ọ-kwa-ra n’efu. Nkpọkọta ahu nile we si, Amen, ha we to Jehova. Ndi-ayi we me dika okwu a si di.

14 Ọzọ, site n’ubọchi o nyerem iwu ibu onye nāchi ha n’ala Juda, site n’arọ nke-orú we rue arọ nke-orú-na-iri-na-abua nke Ataksakses, bú eze, nke ahu bu arọ iri na abua, mu onwem na umu-nnem erighi nri nke onye nāchi ala.

15 Ma ndi mbu nāchi ala ndi burum uzọ, ha bob͕uru ndi-Ju ibu arọ́, we nara ha utu n’achicha na manya-vine, tiyere ọgu shekel ọla-ọcha abua; ọbuná ndi nējere ha ozi bu ndi-isi n’ebe ndi-ayi nọ: ma mu onwem emeghi otú a, n’ihi egwu Chineke.

16 Ọzọ kwa, m’jisiri ike n’ije-ozi mb͕idi a, ọ dighi kwa ubi ayi zutara: ma achikọtawo ndi nile nējerem ozi n’ebe ahu ije ozi ahu.

17 Ọzọ, ndi-Ju na ndi nọchiri anya eze, bú ọgụ ndikom asa na iri, nọ na table nkem, ha na ndi nābiakute ayi site na mba ndi di ayi buruburu.

18 Ma ihe nke edoziworo bayere otù ubòchi bu otù ehi na aturu isi arọputara arọputa; edozi-kwa-ra umu-nnunu nyem, dozi kwa manya-vine nile ọ bula n’uba otù ub͕ò n’ubọchi iri: ma n’ihe a nile ọ dighi nri nke diri onye nāchi ala m’chọrọ, n’ihi na òfùfè ahu di arọ́ n’aru ndi nka.

19 Chinekem, chetaram ihe nile nke m’meworo n’ihi ndi nka, imerem ezi ihe.

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 6

1 O rue, mb͕e Sanbalat, na Tobaia, na Geshem, bú onye Arebia, na ndi-iro-ayi fọduru, nuru na m’lusiri mb͕idi ahu, na ọ dighi kwa ntipú fọduru nime ya; (ọ bu ezie na akaghm-eguzo ibo-ọnu-uzọ n’ọnu-uzọ-ama nile rue mb͕e ahu;)

2 o rue, na Sanbalat na Geshem ziterem ozi, si, Bia, ka ayi zukọta n’otù n’obodo ntà nime ndagwurugwu nke Ono. Ma ndi ahu nēchè èchìchè imejọm emejọ.

3 M’we zigara ha ndi-ozi, si, Ozi uku ka m’nēje, apughkwam irida: n’ìhi gini ka ozi a gākwusi, mb͕e m’nārapu ya, we ridakuru unu?

4 Ha we ziterem ozi ub͕ò anọ dika okwu a si di; m’we zaghachi ha okwu dika okwu a si di.

5 Sanbalat we ziterem onye nējere ya ozi nke ub͕ò ise dika okwu a si di, ya na akwukwọ-ozi nke emegheworo n’aka-ya;

6 edewo nime ya, si, Anuwo ya n’etiti mba nile ọzọ, Gashmu nāsi kwa, na gi onwe-gi na ndi-Ju nēchè èchìchè inupu isi; n’ihi nka ka gi onwe-gi nālu mb͕idi ahu: gi onwe-gi aghọwo-kwa-ra ha eze, dika okwu ndia si di.

7 Ọzọ kwa, i guzowo ndi-amuma ikpọsa òkù bayere gi nime Jerusalem, si, Eze di nime Juda: ma ub͕u a eze gānu ya dika okwu ndia si di. Ma ub͕u a bia, ka ayi durita onwe-ayi ọdu.

8 M’we zigara ya ozi, si, Ọ dighi ka okwu ndia si di nke gi onwe-gi nēkwu, kama gi onwe-gi nēchèputa ha n’obi-gi.

9 N’ihi na ha nile nēme ka ayi tua egwu, si, Aka-ha gākudapu n’ije-ozi a, agaghi-eje kwa ya. Ma ub͕u a Gi me ka akam abua di ike.

10 Ma mu onwem batara n’ulo Shemaia nwa Delaia nwa Mehetabel, ma emechidoworo onye ahu uzọ; o we si, Ka ayi zukọta n’ulo Chineke, n’etiti ulo uku Chineke, ka ayi mechi kwa uzọ nile nke ulo uku Chineke: n’ihi na ha nābia ib͕u gi; e, n’abali ka ha nābia ib͕u gi.

11 M’we si, Nwoke dika mu onwem, ọ̀ gāb͕alaga? ònye di kwa, nke di ka mu onwem, nke gābà n’ulo uku Chineke, we di ndu? m’gaghi-abà nime.

12 M’we mata, ma, le, ọ bughi Chineke zitere ya: kama okwu amuma nka ka o kwuru imegidem: ma Sanbalat na Tobaia goro ya.

13 N’ihi nka ka egoro onye ahu, ka m’we tua egwu, me otú a, we mehie, ka ha we nwe kwa ya inyem aha ọjọ, ka ha we tam uta.

14 Chinekem, cheta Tobaia, cheta kwa Sanbalat, dika omume-ha ndia si di, ọzọ kwa, cheta Noadia, bú onye-amuma-nwayi, cheta kwa ndi-amuma fọduru, ndi nēme ka m’tua egwu.

15 Ewe luzue mb͕idi ahu n’ubọchi nke-orú-na-ise nke ọnwa Elul, n’ọgu ubọchi abua na iri na abua.

16 O rue, mb͕e ndi-iro-ayi nile nuru ya, na mba nile nke di ayi buruburu turu egwu, we da ada nke-uku n’anya nke aka ha: ha we mara na esitere n’aka Chineke-ayi je ozi a.

17 Ọzọ, na mb͕e ahu ndi Juda amara aha-ha nēzigara Tobaia ọtutu akwukwọ-ozi, akwukwọ-ozi nke Tobaia nābiaru kwa ha aka.

18 N’ihi na ọtutu madu di nime Juda ndi nwere iyi ha ṅuru ya, n’ihi na di nwa-nwayi Shekania nwa Ara ka ọ bu; Jehohanan nwa-ya lu-kwa-ra nwa-nwayi Meshulam nwa Berekaia na nwunye.

19 Ha nēkwu kwa okwu bayere ezi omume-ya nile n’irum, ha nēburu kwa okwum nile pukuru ya. Akwukwọ-ozi ka Tobaia ziri ime ka m’tua egwu.

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 7

1 O rue, mb͕e alusiri mb͕idi ahu, mb͕e m’guzosi-kwa-ra ibo-ọnu-uzọ-ya nile, mb͕e emesi-kwa-ra ndi-ọnu-uzọ-ama na ndi-ọbù-abù na ndi-Livai ka ha lekọta ozi-ha,

2 na m’nyere Hanani, bú nwa-nnem, na Hananaia, bú onye-isi ulo uku eze, iwu bayere Jerusalem: n’ihi na onye ahu bu onye ezi-okwu, ọ nātu kwa egwu Chineke kari ọtutu madu.

3 M’we si ha, Ka aghara imeghepu ọnu-uzọ-ama Jerusalem rue mb͕e anyanwu di ọku; na mb͕e ndi-nche nēguzo kwa na nche-ha, ka ha mechie uzọ, kpọchi-kwa-nu ha: guzo kwa ndi bi na Jerusalem na nche, nwoke ọ bula nime nche-ya, nwoke ọ bula kwa na ncherita-iru ulo-ya.

4 Ma obodo ahu sara mbara n’aka abua, di kwa uku: ma ndi-ayi di ole-na-ole n’etiti ya, ulo adighi kwa nke ewuru ewu.

5 Chinekem we tiye ya n’obim, m’we chikọta ndi amara aha-ha, na ndi nọchiri anya eze, na ndi-ayi nile, ka ewe de ha n’akwukwọ-osuso-ọmumu. M’we chọta akwukwọ osuso-ọmumu nke ndi rigotaworo na mbu, m’we hu ihe a edeworo nime ya:

6 Ndia bu umu ala ahu anāchi achi, ndi nārigo, bú ndi sitere na ndọta-n’agha ahu nke ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, ndi Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ha je biri n’ala ọzọ, ha we lata na Jerusalem, lata kwa na Juda, nwoke ọ bula n’obodo-ya;

7 ndi nābia, ha na Zerubabel, na Jeshua, na Nehemaia, na Azaraia, na Raamia, na Nahamani, na Mọdekai, na Bilshan, na Misperet, na Bigvai, na Nehum, na Beana. Ọnu-ọgugu ndikom nke ndi Israel:

8 Umu Parosh, nnù ise na ọgu asatọ na iri na abua.

9 Umu Shefataia ọgu iri-na-asatọ na iri na abua.

10 Umu Ara, nnù na ọgu iri-na-abua na iri na abua.

11 Umu Pahat-moab, nke umu Jeshua na Joab, nnù asa na iri na asatọ.

12 Umu Ilam, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ.

13 Umu Zatu, nnù abua na ọgu abua na ise.

14 Umu Zakai, nnù na ọgu iri-na-asatọ.

15 Umu Binui, nnù na ọgu iri-na-abua na asatọ.

16 Umu Bebai, nnù na ọgu iri-na-otù na asatọ.

17 Umu Azgad, nnù ise na ọgu iri-na-isi na abua.

18 Umu Adonikam, nnù na ọgu iri-na-atọ na asa.

19 Umu Bigvai, nnù ise na ọgu atọ na asa.

20 Umu Adin, nnù na ọgu iri-na-abua na iri na ise.

21 Umu Atea, nke Hezekaia, ọgu anọ na iri na asatọ.

22 Umu Hashum, ọgu iri-na-isi na asatọ.

23 Umu Bezai, ọgu iri-na-isi na anọ.

24 Umu Harif, ọgu ise na iri na abua.

25 Umu Gibeon, ọgu anọ na iri na ise.

26 Ndikom Bet-lehem na Netofa, ọgu iteghete na asatọ.

27 Ndikom Anatot, ọgu isi na asatọ.

28 Ndikom Bet-azmavet, ọgu abua na abua.

29 Ndikom Kiriat-jearim na Kefira na Beirot, nnù na ọgu iri-na-asa na atọ.

30 Ndikom Rema na Geba, nnù na ọgu iri-na-otù na otù.

31 Ndikom Mikmas, ọgu isi na abua.

32 Ndikom Bet-el na Ai, ọgu isi na atọ.

33 Ndikom Nebo nke-ọzọ, ọgu abua na iri na abua.

34 Umu Ilam nke-ọzọ, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ.

35 Umu Harim, ọgu iri-na-isi.

36 Umu jeriko, ọgu iri-na-asa na ise.

37 Umu Lod na Hadid na Ono, nnù n’ ọgu na iri-na-isi na otù.

38 Umu Senaa, nnù iteghete na ọgu iri-na-isi na iri.

39 Ndi-nchu-àjà: umu Jedaia, nke ulo Jeshua, nnù abua na ọgu asatọ na iri na atọ.

40 Umu Imea, nnù abua na ọgu iri-na-abua na iri na abua.

41 Umu Pashua, nnù atọ na ọgu abua na asa.

42 Umu Harim, nnù abua na ọgu iri na iri na asa.

43 Ndi Livai: umu Jeshua, nke Kadmiel, nke umu Hodeva, ọgu atọ na iri na anọ.

44 Ndi ọbù-abù: umu Esaf, ọgu asa na asatọ.

45 Ndi-ọnu-uzọ-ama: umu Shalum, na umu Atea, na umu Talmon, na umu Akub, na umu Hatita, na umu Shobai, ọgu isi na iri na asatọ.

46 Netinim: umu Ziha, na umu Hasufa, na umu Tabaot;

47 na umu Keros, na umu Sia, na umu Padon;

48 na umu Lebana, na umu Hagaba, na umu Salmai;

49 na umu Hanan, na umu Gidel, na umu Gaha;

50 na umu Reaia, na umu Rezin, na umu Nekoda;

51 na umu Gazam, na umu Uza, na umu Pasea;

52 na umu Besai, na umu Meunim, na umu Nefushesim;

53 na umu Bakbuk, na umu Hakufa, na umu Hahua;

54 na umu Bazlit, na umu Mehida, na umu Hasha;

55 na umu Bakos, na umu Sisera, na umu Tema;

56 na umu Nezia, na umu Hatifa.

57 Umu ndi-orù Solomon: umu Sotai, na umu Soferet, na umu Perida;

58 na umu Jaala, na umu Dakon, na umu Gidel;

59 na umu Shefataia, na umu Hatil, na umu Pokeret-hazebaim, na umu Emon.

60 Netinim nile, na umu ndi-orù Solomon, di ọgu iri-na-iteghete na iri na abua.

61 Ndia bu kwa ndi nārigo site na Tel-mela na Tel-hasha na Kerub na Adon na Imea: ma ha apughi igosi ulo nke ndi bu nna-ha, ma-ọbu nkpuru-ha, ma ọ bu Israel ka ha siri puta:

62 umu Delaia, na umu Tobaia, na umu Nekoda, nnù na ọgu iri-na-abua na abua.

63 Site kwa na ndi-nchu-àjà: umu Họbaia, na umu Hakoz, na umu Bazilai, onye luru nwunye sitere n’umu-ndinyom Bazilai, bú onye Gilead, ewe kpọ ya aha n’aha-ha.

64 Ndia chọrọ odide-akwukwọ-ha n’etiti ndi edere n’akwukwọ-osuso-ọmumu, ma achọtaghi ya: ewe gua ha na ndi nādighi nsọ, ewe wepu ha n’ọlu-nchu-àjà.

65 Tiashata we si ha, ka ha ghara iri ihe n’ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, rue mb͕e onye-nchu-àjà gēwere Ìhè na Izu-okè guzo.

66 Nkpọkọta ahu nile n’otù di orú nnù uzọ ise na nnù ise na ọgu iri-na-asatọ,

67 nāgughi orù-ha ndikom na orù-ha ndinyom, ndi di nnù iri-na-asatọ na ọgu isi na iri na asa: ha nwe-kwa-ra ọgu madu iri-na-abua na ise bu ndikom nābù abù na ndinyom nābù abù.

68 Inyinya-ha di nnù na ọgu iri-na-isi na iri na isi; inyinya mule ha di ọgu iri-na-abua na ise;

69 camel-ha di nnù na orú na iri na ise; inyinya-ibu-ha di nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-isi.

70 Ma ufọdu n’etiti ndi-isi ulo nke ndi bu nna nyere onyinye nke diri ije-ozi ahu. Tiashata tiyere n’ulo-àkù nnù daric ọla-edo abua na ọgu iri, na ọgu ọkwa-nwusa abua na iri, na nnù uwe ndi-nchu-àjà na ọgu isi na iri.

71 Ma ufọdu n’etiti ndi-isi ulo nke ndi bu nna tiyere n’ulo-àkù nke ije-ozi ahu orú nnù daric ọla-edo uzọ abua na nnù iri, na nnù pound ọla-ọcha ise na ọgu iri.

72 Ma nke ndi-ayi fọduru nyere di orú nnù daric ọla-edo uzọ abua na nnù iri, na nnù pound ọla ọcha ise, na ọgu uwe ndi-nchu-àjà atọ na asa.

73 Ndi-nchu-aja, na ndi Livai, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na ndi-ọbù-abù, na ufọdu nime ndi Juda, na Netinim, na Israel nile, we biri n’obodo nile ha. Ọnwa nke-asa we rue, umu Israel nọ kwa n’obodo nile ha.

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 8

1 Ndi ahu nile we chikọta onwe-ha dika otù onye rue amá nke di n’iru ọnu-uzọ-ama miri; ha we si Ezra, bú ode-akwukwọ, ka o weta akwukwọ iwu Moses, nke Jehova nyere Israel n’iwu.

2 Ezra, bú onye-nchu-àjà, we weta iwu ahu n’iru nkpọkọta Israel, ma ndikom ma ndinyom, ma onye ọ bula nke nāghọta inu ihe, n’ubọchi mbu nke ọnwa nke-asa.

3 O we gua nime ya n’iru amá nke di n’iru ọnu-uzọ-ama miri site oge ututu rue etiti-ehihie, n’iru ndikom na ndinyom na ndi nāghọta ihe; ndi ahu nile we ṅa nti akwukwọ iwu ahu.

4 Ezra, bú ode-akwukwọ, we guzo n’elu ulo-elu osisi, nke ha mere bayere ihe a; Matitaia, na Shema, na Anaia, na Uraia, na Hilkaia, na Maaseia, we guzo n’akuku ya, n’aka-nri-ya; Pedaia kwa, na Mishael, na Malkija, na Hashum, na Hashbadana, na Zekaraia, na Meshulam, n’aka-ekpe-ya.

5 Ezra we saghe akwukwọ n’anya ndi ahu nile; (n’ihi na ọ nọ n’elu n’ebe ndi ahu nile nọ;) ma mb͕e ọ saghere ya, ndi ahu nile guzoro:

6 Ezra we gọzie Jehova, bú Chineke uku. Ndi ahu nile we za, si, Amen, Amen, n’ichili aka-ha elu: ha we rube isi-ha, kpọ isi ala nye Jehova, kpue iru-ha n’ala.

7 Ọzọ, Jeshua, na Bani, na Sherebia, na Jamin, na Akub, na Shabetai, na Hodia, na Maaseia, na Kelita, na Azaraia, na Jozabad, na Hanan, na Pelaia, na ndi Livai, mere ka ndi ahu ghọta iwu ahu: ndi ahu nēguzo kwa n’ebe-nguzo-ha.

8 Ha wee gua n’akwukwọ ahu, bú n’iwu Chineke, guputa ya nke-ọma, we me ka amata isi-ya, ha we ghọta ọgugu-ya.

9 Nehemaia, nke ya onwe-ya bu Tiashata, na Ezra onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ, na ndi Livai, bú ndi nēzí ndi ahu ihe, we si ndi ahu nile, Ta, ihe nsọ nke diri Jehova, bú Chineke-unu, ka ọ bu; unu erula újú, akwa-kwa-la ákwá. N’ihi na ndi ahu nile nākwa ákwá, mb͕e ha nuru okwu nile nke iwu ahu.

10 O we si ha, Jerenu onwe-unu, rie ihe mara abuba, ṅua ihe-ọṅuṅu di utọ, were òkè zigara ndi ọ nādighi ihe edoziworo ha: n’ihi na nsọ ka ubọchi ta diri Onye-nwe-ayi: ihe ewuta-kwa-la unu; n’ihi na ọṅù Jehova bu ike-unu.

11 Ndi Livai we nēme ka ndi ahu nile b͕a nkiti, si, Nọdunu du, n’ihi na ubọchi a di nsọ, ihe ewuta-kwa-la unu.

12 Ndi ahu nile we je iri ihe, na iṅu ihe ọṅuṅu, na iziga òkè, na ime ka oké ọṅù di, n’ihi na ha ghọtara okwu nile nke emere ka ha mara.

13 Ma n’ubọchi nke-abua achikọtara ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi ahu nile, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, n’ebe Ezra, bú ode-akwukwọ, nọ, ọbuná inwe uche bayere okwu nile nke iwu ahu.

14 Ha we chọputa ihe a edeworo n’iwu, bú na Jehova nyere iwu site n’aka Moses, ka umu Israel nọdu n’ulo-ntu n’ememe di n’ọnwa nke-asa:

15 na ka eme ka anu ka ekwusa kwa n’obodo-ha nile na nime Jerusalem, si, Puanu je n’ugwu, chita akwukwọ osisi olive, na akwukwọ osisi nēnye manu, na akwukwọ osisi myrtle, na igu nkwu, na akwukwọ nke osisi b͕ara n’ọhia, ime ulo-ntu, dika edeworo ya n’akwukwọ.

16 Ndi ahu we je, chita ha, mere onwe-ha ulo-ntu, nwoke ọ bula n’elu-ulo-ya, na n’ogige nile ha, na n’ogige nile nke ulo Chineke, na n’amá nke ọnu-uzọ-ama miri, na n’amá nke ọnu-uzọ-ama Efraim.

17 Nkpọkọta ahu nile nke ndi nālata site na ndọta-n’agha ahu mere ulo-ntu, we nọdu n’ulo-ntu-ha: n’ihi na umu Israel emeghi otú a site n’ubọchi Jeshua nwa Nun rue ubọchi ahu. Oké ọṅù di uku we di.

18 O we nāgu n’akwukwọ iwu Chineke kwa-ubọchi, site n’ubọchi mbu rue ubọchi ikpe-azu. Ha we me ememe ahu ubọchi asa; ma n’ubọchi nke-asatọ ubọchi-nb͕ochi di, dika ikpé-ya si di.

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 9

1 Ma n’ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nka achikọtara umu Israel n’obubu-ọnu, na n’ákwà-nke, ájá dikwasi kwa ha.

2 Nkupuru Israel we kewaputa onwe-ha n’aru ndi ala ọzọ nile, guzo, kwuputa nmehie nile ha, na ajọ omume nile nke ndi bu nna-ha.

3 Ha we bilie n’ebe-nguzo-ha, gua n’akwukwọ iwu Jehova, bú Chineke-ha, otù uzọ n’uzọ anọ nke ubọchi; otù uzọ n’uzọ anọ kwa ka ha nēkwuputa, nākpọ kwa isi ala nye Jehova, bú Chineke-ha.

4 Jeshua, na Bani, na Kadmiel, na Shebania, na Buni, na Sherebia, na Bani, na Kenani, we bilie n’elu ihe-nrigo ndi Livai, were oké olu tikue Jehova, bú Chineke-ha.

5 Ndi Livai, bú Jeshua, na Kadmiel, na Bani, na Hashabneia, na Sherebia, na Hodia, na Shebania, na Petahia, we si, Bilienu, gọzie Jehova, bú Chineke-unu, site na mb͕e edighi-ebi rue mb͕e ebighi-ebi: ka ha gọzi kwa aha-Gi di nsọpuru, nke ebuliworo ya elu kari ngọzi na otuto nile.

6 Gi onwe-gi bu Jehova, nání Gi; Gi onwe-gi emewo elu-igwe, bú elu-igwe nke elu-igwe nile, na usu-ha nile, na uwa na ihe nile nke di n’elu ya, na oké osimiri nile na ihe nile nke di nime ha, Gi onwe-gi nēdebe kwa ha nile ndu; usu ihe elu-igwe nākpọ kwa isi ala nye Gi.

7 Gi onwe-gi, Jehova, bu Chineke ahu Nke rọputara Abram, me ka o si na Ua nke ndi Kaldea puta, I gu-kwa-ra aha-ya Abraham;

8 I hu-kwa-ra na obi-ya kwesiri ntukwasi-obi n’iru Gi, Gi na ya b͕a-kwa-ra ndu na I gēwere ala nke ndi Kenean na ndi Het na ndi-Amorait na ndi Perizait na ndi Jebus na ndi-Giagashait nye, bú iwere ya nye nkpuru-ya, I we me ka okwu-Gi guzosie ike; n’ihi na onye ezi omume ka I bu.

9 I hu-kwa-ra mweda-n’ala nke nna-ayi-hà n’Ijipt, nu kwa iti-nkpu-ha n’akuku Oké Osimiri Uhie;

10 I we tiye ihe-iriba-ama na ihe-ebube n’aru Fero, na n’aru ndi-orù-ya nile, na n’aru ndi nile nke ala-ya; n’ihi na I mara na ha were nganga megide ha; I we mere Onwe-gi aha, dika o si di ta.

11 I kewa-kwa-ra oké osimiri n’iru ha, ha we gabiga n’etiti oké osimiri n’elu ala-akọrọ; ma I tubàra ndi nāchu ha na miri di omimi, dika nkume nime miri di ike.

12 Ọ bu kwa ogidi igwe-oji ka I nēwere du ha n’ehihie; I nēwere kwa ogidi ọku n’abali, inye ha ìhè n’uzọ ahu nke ha gēje ije nime ya.

13 Ọ bu kwa n’elu ugwu Sainai ka I ridara, si n’elu-igwe kpayere ha uka, I we nye ha ikpé ziri ezi na iwu ezi-okwu, na ezi ukpuru na ihe enyere n’iwu:

14 I me-kwa-ra ka ha mara ubọchi-izu-ike nsọ Gi, I were kwa ihe enyere n’iwu, na ukpuru, na iwu, nye ha n’iwu site n’aka Moses, bú orù-Gi:

15 ọ bu kwa nri nke sitere n’elu-igwe ka I nyere ha bayere agu-ha, me kwa ka miri si na nkume di elu putara ha bayere akpiri-ikpọ-nku-ha, I si-kwa-ra ha ba nime inweta ala ahu nke I weliri aka-Gi inye ha.

16 Ma ndi ahu na nna-ayi-hà mere ihe na nganga, kwesie olu-ha ike, ha egeghi kwa nti ihe nile I nyere n’iwu,

17 ha we ju inu ihe, ha echetaghi kwa oké ọlu-Gi nile nke I luru n’etiti ha; ha we kwesie olu-ha ike, do onye-isi nime nnupu-isi-ha ilaghachi n’ọbubu-orù-ha: ma Gi onwe-gi bu Chineke nke nb͕aghara nmehie, Onye nēme amara nwe kwa obi-ebere, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Onye nāba uba n’ebere, I rapughi kwa ha.

18 Ọbuná mb͕e ha mere nwa-ehi awuru awu nye onwe-ha, si, Nka bu chi-gi nke mere ka i si n’Ijipt rigoputa, ha we me oké ihe-nlelì-anya;

19 ma Gi onwe-gi n’ọtutu obi-ebere-Gi arapughi ha n’ọzara: ogidi igwe-oji esighi n’elu ha wezuga onwe-ya n’ehihie, idu ha n’uzọ-ha; ogidi ọku ewezugaghi kwa onwe-ya n’abali, inye ha na uzọ ahu nke ha nēje ije nime ya ìhè.

20 I nye-kwa-ra ezi Mọ nke Gi ime ka ha nwe uche, I b͕ochighi kwa manna-Gi n’ọnu-ha, I nye-kwa-ra ha miri bayere akpiri-ikpọ-nku-ha.

21 Ọ bu kwa ọgu arọ abua ka I zùru ha n’ọzara, ọ dighi kwa ihe kọrọ ha; uwe-ha akaghi nká, ukwu-ha azaghi kwa aza.

22 Ọzọ, I nyere ha ala-eze na ndi di iche iche, we kè ha n’òkè n’òkè n’akuku nile: ha we nweta ala Saihon, bú ala nke eze Heshbon, na ala Og, bú eze Beshan.

23 I me-kwa-ra ka umu-ha ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, I we me ka ha ba n’ala ahu nke I siri ndi bu nna-ha ka ha ba inweta ya.

24 Umu-ha we ba, nweta ala ahu, I we ruru ndi bi n’ala ahu, bú ndi Kenean, ala n’iru ha, were ha, na ndi-eze-ha, na ndi di iche iche nke ala ahu, nye n’aka-ha, ka ha were ha me dika ọ tọrọ ha utọ

25 Ha we were obodo di iche iche ewusiri ike, na ala nwere ume, ha nweta-kwa-ra ulo juputara n’ezi ihe nile, na olùlù-miri egwuwara egwuwa, na ubi-vine, na ubi-olive, na ọtutu osisi nāmi nkpuru anēri eri: ha we rie ihe, afọ ju-kwa-ra ha, ha we gba abuba, ezi ihe uku Gi we tọ ha utọ.

26 Ma ha juru Gi aju, nupu isi megide Gi, tufue iwu-Gi n’azu ha, b͕ue ndi-amuma-Gi ndi b͕ara àmà megide ha ime ka ha chigharikute Gi, ha we me oké ihe-nlelì.

27 I we nye ha n’aka ndi nākpab͕u ha, ha we kpab͕ue ha: ma na mb͕e nkpab͕u-ha, ha we tikue Gi, Gi onwe-gi we site n’elu-igwe nu, nye ha ndi-nzọputa dika ọtutu obi-ebere-Gi nile si di, ha we zọputa ha n’aka ndi nākpab͕u ha.

28 Ma mb͕e izu-ike diri ha, ha me-kwa-ra ihe ọjọ n’iru Gi ọzọ: I we rapu ha n’aka ndi-iro-ha, ha we nwe ike n’aru ha: ha we laghachi, tikue Gi, Gi onwe-gi we site n’elu-igwe nu, naputa ha ọtutu ub͕ò dika obi-ebere-Gi si di,

29 I we b͕a àmà megide ha, ime ka ha lata n’iwu-Gi: ma ndi ahu mere ihe na nganga, ha egeghi kwa nti ihe nile I nyere n’iwu, kama ha mehiere megide ikpé-Gi nile, (nke madu nēme nādi kwa ndu nime ha,) ha we wezuga ubu-ha, kwesie olu-ha ike, ha anughi kwa.

30 Ma I nēme ka ọtutu arọ di ogologo n’isi ha, I we were Mọ-Gi b͕a àmà megide ha site n’aka ndi-amuma-Gi: ma ha aṅaghi nti: I we nye ha n’aka ndi di iche iche nke ala ọzọ.

31 Ma n’ọtutu obi-ebere-Gi I meghi ka ha gwusia, I rapughi kwa ha; n’ihi na Chineke Nke nēme amara, Nke nwe kwa ra obi-ebere, ka I bu.

32 Ma ub͕u a, Chineke-ayi, Chineke uku, Nke bu dike, Nke di kwa egwu, Gi Onye nēdebe ọb͕ub͕a-ndu na ebere, ka ike-ọgwugwu nile ghara idi ntà n’iru Gi, bú nke gwuworo ayi, gwu kwa ndi-eze-ayi, gwu kwa ndi-isi-ayi, gwu kwa ndi-nchu-àjà-ayi, gwu kwa ndi-amuma-ayi, gwu kwa nna-ayi-hà, gwu kwa ndi-Gi nile, site n’ubọchi ndi-eze Asiria rue ta.

33 Ma Gi onwe-gi bu onye ezi omume bayere ihe nile nke biakwasiworo ayi; n’ihi na ihe bu ezi-okwu ka I meworo, ma ayi onwe-ayi emebiwo iwu:

34 ndi-eze-ayi, na ndi-isi-ayi, na ndi-nchu-àjà-ayi, na nna-ayi-hà, ha emeghi kwa iwu-Gi, ha aṅaghi kwa nti n’ihe nile I nyere n’iwu na n’àmà-Gi nile, nke I b͕ara megide ha.

35 Ha onwe-ha efèghi kwa Gi n’ala-eze-ha, na n’ezi ihe-Gi bara uba nke I nyere ha, na n’ala ahu sara mbara nke nwe-kwa-ra ume, nke I tiyere n’iru ha, ha esighi kwa n’omume ọjọ nile ha chigharia.

36 Le, ayi onwe-ayi bu ndi-orù ta, ma ala ahu nke I nyere nna-ayi-hà iri nkpuru-ya na ezi ihe-ya, le, ayi onwe-ayi bu ndi-orù nime ya.

37 Ọ nēme-kwa-ra ndi-eze ọtutu ihe-ọmume, bú ndi I doro ndi-isi-ayi n’ihi nmehie nile ayi: ha nāchi kwa aru-ayi, na n’etiti anu-ulo-ayi, dika ọ nātọ ha utọ, ọ bu kwa na nkpab͕u uku ka ayi nọ.

38 Ma n’ihi ihe a nile ka ayi onwe-ayi nēme ọb͕ub͕a-ndu kwesiri ntukwasi-obi, ayi nēde kwa ya n’akwukwọ; ndi-isi-ayi na ndi Livai ayi na ndi-nchu-àjà-ayi bu kwa ndi-isi n’ikà ihe ahu akara akàrà.

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 10

1 Ma ndi bu ndi-isi n’ikà ihe nile akara akàrà bu, Nehemaia, bú Tiashata, nwa Hakalaia, na Zedekaia;

2 na Seraia, na Azaraia, na Jeremaia;

3 na Pashua, na Amaraia, na Malkija;

4 na Hatush, na Shebania, na Maluk;

5 na Harim, na Meremot, na Obadaia;

6 na Daniel, na Gineton, na Beruk;

7 na Meshulam, na Abaija, na Mijamin;

8 na Maazia, na Bilgai, na Shemaia; ndia bu ndi-nchu-àjà.

9 Ndi Livai kwa: bú Jeshua nwa Azania, na Binui nke sitere n’umu Henadad, na Kadmiel;

10 na umu-nne-ha, bú Shebania, na Hodia, na Kelita, na Pelaia, na Hanan;

11 na Maika, na Rehob, na Hashabaia;

12 na Zakua, na Sherebia, na Shebania;

13 na Hodia, na Bani, na Beninu.

14 Ndi-isi ndi Israel: bú Parosh, na Pahat-moab, na Ilam, na Zatu, na Bani;

15 na Buni, na Azgad, na Bebai;

16 na Adonaija, na Bigvai, na Adin;

17 na Atea, na Hezekaia, na Azua;

18 na Hodia, na Hashum, na Bezai;

19 na Harif, na Anatot, na Nobai;

20 na Magpiash, na Meshulam, na Hezia;

21 na Meshezabel, na Zedok, na Jadua;

22 na Pelataia, na Hanan, na Anaia;

23 na Hoshea, na Hananaia, na Hashub;

24 na Halohesh, na Pilha, na Shobek;

25 na Rehum, na Hashabna, na Maaseia;

26 na Ahia, na Hanan, na Anan;

27 na Maluk, na Harim, na Beana.

28 Ndi-ayi fọduru, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na ndi-ọbù-abù, na Netinim, na onye ọ bula nke siworo n’etiti ndi iche iche nke ala ọzọ kewapuru iwu Chineke onwe-ya, ha na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ha ndiyom, onye ọ bula nke mara ihe, nke nāghọta kwa ihe;

29 ha nēkekọta onwe-ha n’aru umu-nne-ha, bú ndi-ha di ebube, ha nābà kwa n’ọb͕ub͕a-iyi na n’ọṅuṅu-iyi, ijeghari n’iwu Chineke, nke enyere site n’aka Moses, bú orù Chineke, na idebe na ime ihe nile Jehova, bú Onye-nwe-ayi, nyere n’iwu, na ikpé-Ya nile na ukpuru-Ya nile;

30 ọzọ kwa, na ayi agaghi-enye ndi di iche iche nke ala ahu umu-ayi ndinyom, na ayi agaghi-aluta-kwa-ra umu-ayi ndikom umu-ha ndinyom:

31 ọzọ, ndi di iche iche nke ala ahu ndi nēwebata ihe-ahia na ọka ọ bula n’ubọchi-izu-ike ire ere, na ayi agaghi-azuru n’aka-ha n’ubọchi-izu-ike, ma-ọbu n’ubọchi nsọ: ọzọ, na ayi gārapu arọ nke-asa na ihe-nbinye ọ bula.

32 Ayi me-kwa-ra ihe enyere n’iwu ka ha guzoro ayi, bú ibokwasi onwe-ayi otù uzọ n’uzọ atọ nke otù shekel n’arọ iji fè òfùfè ulo Chineke-ayi;

33 bayere achicha anēdebe n’usoro, na onyinye-inata-iru-ọma anēnye mb͕e nile, baye-kwa-ra àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e nile, nke ubọchi-izu-ike nile, na nke ọnwa ọhu nile, bayere mb͕e nile akara àkà, baye-kwa-ra ihe nsọ nile, baye-kwa-ra àjà-nmehie nile ikpuchiri Israel nmehie, bú ije-ozi nile nke ulo Chineke-ayi.

34 Ayi fe-kwa-ra nzà, bú ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi-ayi nile, bayere onyinye iji biaru nso, bú nkú, iwebata ya n’ulo Chineke-ayi, dika ulo nna-ayi-hà si di, na mb͕e ezubere, kwa-arọ, isure n’elu ebe-ichu-àjà Jehova, bú Chineke-ayi, dika edeworo ya n’iwu:

35 na iwebata nkupuru mbu nke ala-ubi-ayi, na nkpuru mbu nke nkpuru nile nke osisi nile, kwa-arọ, n’ulo Jehova:

36 na umu eburu uzọ mu nke umu-ayi ndikom na nke anu-ulo-ayi, dika edeworo ya n’iwu, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-ayi na nke ìgwè ewu na aturu-ayi, iwebata ha n’ulo Chineke-ayi, nye ndi-nchu-àjà ndi nēje ozi n’ulo Chineke-ayi:

37 na ayi gēwebata-kwa-ra ndi-nchu-àjà utu ọka mbu ayi, na àjà-nbuli nile ayi, na nkpuru nke osisi nile ọ bula, na manya-vine ọhu, na manu, rue ime-ulo nke ulo Chineke-ayi; webata-kwa-ra ndi Livai otù uzọ n’uzọ iri nke ihe ala-ubi-ayi; n’ihi na ha onwe-ha, bú ndi Livai, nānara otù uzọ n’uzọ iri n’obodo nile nke ọlu-ubi-ayi.

38 Onye-nchu-àjà, bú nwa Eron, gānọye-kwa-ra ndi Livai, mb͕e ndi Livai nānara otù uzọ n’uzọ iri: ndi Livai gēwegota kwa otù uzọ n’uzọ iri nime otù uzọ n’uzọ iri nile rue ulo Chineke-ayi, rue ime-ulo, rue ulo àkù.

39 N’ihi na umu Israel na umu Livai gēwebata àjà-nbuli nke ọka na manya-vine ọhu na manu n’ime-ulo, ọ bu kwa n’ebe ahu ka ihe nile nke ebe nsọ di, ha na ndi-nchu-àjà ndi nēje ozi, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na ndi-ọbù-abù: ayi agaghi-arapu kwa ulo Chineke-ayi.