Categories
NDI ROM

NDI ROM 11

1 Ya mere asim, Ọ̀ gābu na Chineke nupuru ndi nke Ya? Chineke ekwela. N’ihi na mu onwem bu kwa onye Israel, si na nkpuru Abraham puta, si kwa n’ebo Benjamin puta.

2 Chineke enupughi ndi-Ya nke O buru uzọ mara. Ma-ọbu ùnu amataghi ihe ọ nēkwu, bú ihe edeworo n’akwukwọ nsọ, n’ebe edeworo okwu bayere Elaija? otú ọ nāriọ Chineke aririọ megide Israel, si,

3 Onye-nwe-ayi, ha b͕uru ndi-amuma-Gi, ha gwudara ebe-ichu-àjà-Gi nile: nání mu onwem fọdu-kwa-ra, ha nāchọ kwa ndum.

4 Ma gini ka ndum-ọdu Chineke nāgwa Ya? Arapurum nye Onwem nnù ndikom iri-na-asa na ọgu iri, madu ndi ọ dighi mb͕e ha b͕uru ikperè nye Beal.

5 Ya mere otú a n’oge di ub͕u a ndi fọduru aputawo kwa dika nrọputa nke amara si di.

6 Ma ọ buru na ọ di n’amara, o siteghi kwa ọzọ n’ọlu: ebe ahuru na amara abughi amara ọzọ, ma asi na ọ dighi otú a.

7 Gini kwa? Ihe Israel nāchọ, nke ahu ka ọ nāhughi; ma nrọputa ahu huru ya, ma emere ka obi ndi fọduru me etili:

8 dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si, Chineke nyere ha mọ nke oké ura, anya ighara ihu uzọ, na nti ighara inu ihe, rue ubọchi ta.

9 Devid nāsi kwa,

Ka table-ha ghọ ib͕udu, na ihe eji achu ha ntà,

Na ọnyà, na ihe-nnyeghachi n’ebe ha nọ:

10 Ka anya-ha b͕a ọchichiri, ka ha we ghara ihu uzọ,

Gi me kwa ka azú-ha ruru mb͕e nile.

11 Ya mere m’nāsi, Ọ̀ gābu na ha suru ngọngọ ka ha we da? Chineke ekwela: kama nzọputa sitere na ndahie-ha ru ndi mba ọzọ aka, ka ewe kpasue ha ekworo.

12 Ma ọ buru na ndahie-ha bu àkù nke uwa, ọ buru kwa na ila-ala-ha bu àkù nke ndi mba ọzọ; òzùzù-ha gēsi aṅa ghara ibu kari àkù-ha nke-uku?

13 Ma ọ bu unu ndi mba ọzọ ka m’nāgwa okwu, (n’ezie, ka ọ ra, bú onye-ozi nke ndi mba ọzọ mu onwem bu, anamenye ije-ozim otuto):

14 ma ọ buru na agamakpasu ndi-arum ekworo n’uzọ ọ bula, we zọputa ufọdu n’etiti ha.

15 N’ihi na asi na nchupu-ha bu ime ka uwa na Chineke di n’otù, gini ka nkpọbata-ha gābu, ma-ọbughi ndu sitere na ndi nwuru anwu?

16 Ma ọ buru na nkpuru mbu di nsọ, ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ di kwa nsọ: ọ buru kwa na nkpọrọgwu di nsọ, alaka di kwa nsọ.

17 Ma ọ buru na anyakapuru alaka ufọdu, ma gi onwe-gi, ọ bu ezie na i bu osisi olive nke ọhia, ma anyakudoro gi n’etiti ha, i ghọ-kwa-ra onye gi na ha nēnwekọ nkpọrọgwu nke umi nke olive ahu;

18 anyalara alaka ahu isi: ma ọ buru na i nānyara ha isi, ọ bughi gi onwe-gi nēbu nkpọrọgwu, kama ọ bu nkpọrọgwu nēbu gi.

19 Ya mere i gāsi, Anyakapuru alaka ufọdu ka ewe nyakudo mu onwem.

20 Ọ di nma; n’ekweghi-ekwe-ha ka anyakapuru ha, ma gi onwe-gi nēguzo n’okwukwe-gi. Atukwasila uche-gi n’ihe di elu, kama nātu egwu:

21 n’ihi na asi na Chineke emeghi alaka ahu osisi olive ji puta uwa ebere, Ọ gaghi-eme kwa gi ebere.

22 Ya mere le obi-ọma na aka-ike nke Chineke: n’aru ndi ndi a ka aka-ike-Ya dakwasiri; ma n’aru gi ka obi-ọma Chineke nādikwasi, ma ọ buru na i gānọgide n’obi-ọma-Ya: ebe agēbipu kwa gi onwe-gi ma ọ buru na i nọgideghi otú a.

23 Ndi ahu kwa, ma ọ buru na ha anọgideghi n’ekweghi-ekwe-ha, agānyakudo ha: n’ihi na Chineke puru inyakudo ha ọzọ.

24 N’ihi na asi na ebipuru gi onwe-gi n’osisi olive nke bu nke ọhia ka o si puta uwa, ewe nyakudo gi n’osisi olive ọma n’uzọ nke nēmegide ka o si puta uwa: àgēsi aṅa ghara inyakudo kari ndi ahu nke-uku, bú alaka osisi olive ji puta uwa, n’osisi olive nke aka ha?

25 N’ihi na achọghm ka unu ghara ima ihe-omimi a, umu-nnam, ka unu ghara inwe uche n’anya onwe-unu, na emewo Israel obi-etili ufọdu, rue mb͕e ozùzù ndi mba ọzọ gābata;

26 otú a agāzọputa kwa Israel nile: dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si,

Onye-ndọputa ahu gēsi na Zaion puta;

Ọ gēchighari asọpurughi-Chineke nile ka ọ pua na Jekob:

27 Nka bu kwa ọb͕ub͕a-ndu gādiri ha site n’ebe M’nọ,

Mb͕e ọ bula M’gēwepu nmehie nile ha.

28 N’akuku ozi ọma, ha bu ndi-iro n’ihi unu: ma n’akuku nrọputa, ha bu ndi ahuru n’anya n’ihi nna-ayi-hà.

29 N’ihi na nchèghari adighi n’onyinye-amara nile na ọkpukpọ nke Chineke.

30 N’ihi na dika unu onwe-unu nēkweyeghi Chineke n’oge gara aga, ma ub͕u a emere unu ebere n’ekweyeghi-ekweye nke ha,

31 otú a ka ndia nēkweyeghi kwa ub͕u a, ka ewe were ebere emere unu mere ha onwe-ha ebere ub͕u a.

32 N’ihi na Chineke mechibidoro ha nile nime ekweyeghi-ekweye, ka O we mere ha nile ebere.

33 A! omimi nke àkù nke amam-ihe na nke ihe-ọmuma kwa nke Chineke! le otú anēnweghi ike ichọputa ikpé-Ya nile, otú anēnweghi kwa ike ituputa uzọ-Ya nile!

34 N’ihi na ònye mara uche Onye-nwe-ayi? ma-ọbu ònye putara ibu onye Ya na ya nāb͕a izù?

35 ma-ọbu ònye buru uzọ nye Ya, agēnyeghachi kwa ya ọzọ?

36 N’ihi na ihe nile sitere nime Ya, site kwa n’aka-Ya, di-kwa-ra Ya. Ọ bu Ya ka otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

Categories
NDI ROM

NDI ROM 12

1 Ya mere, umu-nnam, ejim obi-ebere nile nke Chineke nāriọ unu, ka unu che aru-unu n’iru Chineke, dika àjà di ndu, di nsọ, nke di Chineke ezi utọ, nke bu ikpe-ekpere-unu dika uche si di.

2 Unu ekwe-kwa-la ka eme ka unu yie ajọ oge a: kama ka enwogha unu site n’ime ka uche-unu buru ihe ọhu, ka unu we nwaputa ihe bu ihe Chineke nāchọ, bú ezi ihe nke di kwa Ya ezi utọ nke zu-kwa-ra okè.

3 N’ihi na esiterem n’amara nke enyerem si onye ọ bula nọ n’etiti unu, ka ọ ghara itukwasi uche n’onwe-ya kari nke o kwesiri itukwasi uche; kama itukwasi uche n’inwe uche zuru okè, dika Chineke kère ọtùtù nke okwukwe nye madu nile n’otù n’otù.

4 N’ihi na ọbuná dika ayi nwere ọtutu ihe n’otù aru, ma ihe ahu nile di n’aru enweghi otù ọlu:

5 otú a ayi, ndi di ọtutu, bu otù aru nime Kraist, buru kwa n’otù n’otù ihe di n’aru ibe-ayi.

6 Ma ebe ayi nwere onyinye-amara di iche iche dika amara nke enyere ayi si di, ma ayi nwere ibu-amuma, ka ayi nēbu amuma ka okwukwe-ayi ra;

7 ma-ọbu ije-ozi, ka ayi nānọ n’ije-ozi-ayi; ma-ọbu onye nēzi ihe, ya nọ n’ozizi-ya;

8 ma-ọbu onye nākasi obi, ya nọ na nkasi-obi-ya: onye nēme ka ndi ọzọ keta ihe o nwere, ya were afọ-ofufo me ya; onye bu onye-isi, ya were obi nānu ọku nābu isi; onye nēme ebere, ya were obi-utọ me ya.

9 Ka ihu-n’anya buru ihe nke iru-abua nādighi nime ya. Nākpọnu ajọ ihe asì; nārapara ezi ihe n’aru.

10 N’akuku ihu-n’anya-unu n’ebe umu-nna-unu nọ, ka ihe madu-ibe-unu nātọrita unu utọ nke-uku; n’akuku nsọpuru-unu, nācharanu ibe-unu uzọ;

11 n’akuku inu-ọku nke obì-unu, nāgharanu idi ọ̀bọ̀; n’akuku mọ-unu, nādinu ọku; n’akuku Onye-nwe-ayi, nābunu orù;

12 n’akuku olile-anya-unu, nāṅurinu ọṅu; n’akuku nkpab͕u-unu, nēnwenu ntachi-obi; n’akuku ekpere-unu, nānọgidesinu ike;

13 n’akuku ihe nākpà ndi nsọ, nēnwekọnu ihe; nāb͕asonu ọlu ile ndi-ọbìa anya nke-ọma.

14 Nāgọzinu ndi nēsob͕u unu; nāgọzinu, abu-kwa-la ha ọnu.

15 Nēsonu ndi nāṅuri n’iṅuri ọṅu; nēsonu ndi nākwa ákwá n’ikwa ákwá.

16 Nātukwasinu uche n’otù ihe ahu n’ebe ibe-unu nọ. Unu atukwasila uche n’ihe di elu, kama ka ndi ọnọdu-ha di ala nādọrọ unu iso ha. Unu enwela uche n’anya onwe-unu.

17 Unu enyeghachila onye ọ bula ihe ọjọ n’ọnọdu ihe ọjọ. Burunu uzọ nēchè ihe ọma n’iru madu nile.

18 Asi na ọ bu ihe gēkwe unu, ka ihe nke diri unu onwe-unu ra, unu na madu nile nādi n’udo.

19 Ndi m’huru n’anya, unu abọlara onwe-unu ọ́bọ̀, kama charanu iwe ahu uzọ: n’ihi na edewo ya n’akwukwọ nsọ, si, Mu nwe ọ́bọ̀; Mu onwem gēnyeghachi, ka Onye-nwe-ayi kwuru.

20 Ma ọ buru na agu nāgu onye-iro-gi, nāzù ya; ọ buru na akpiri nākpọ ya nku, gi me ka ọ ṅua miri: n’ihi na n’ime nka i gāgukwasi icheku nēre ọku n’isi-ya.

21 Ekwela ihe ọjọ meri gi, kama were ezi ihe meri ihe ọjọ.

Categories
NDI ROM

NDI ROM 13

1 Ka nkpuru-obi ọ bula do onwe-ya n’okpuru ndi nāchi isi n’elu ya: n’ihi na ọ dighi onye ọ bula nāchi isi ma ọ buru na Chineke edoghi ya; ndi nāchi isi bu kwa ndi Chineke doworo.

2 Ya mere onye nēdo onwe-ya megide onye ahu nāchi isi, ọ nēguzogide iwu Chineke nyere: ma ndi nēguzogide gānata ikpé nye onwe-ha.

3 N’ihi na ndi-isi abughi ihe-egwu n’ebe ezi ọlu di, kama n’ebe ọlu ọjọ di. Ma ì chọghi ka i tua egwu onye ahu nāchi isi? nēme ezi ihe, i gēnwe kwa otuto site n’aka ya:

4 n’ihi na ọ bu onye nējere Chineke ozi n’ebe i nọ iwetara gi ezi ihe. Ma ọ buru na i nēme ihe ọjọ, tua egwu; n’ihi na ọ bughi n’efu ka o nēbu mma-agha: n’ihi na ọ bu onye nējere Chineke ozi, onye-ọ́bọ̀ iwetara onye nēme ihe ọjọ iwe.

5 N’ihi ya ọ di nkpà ido onwe-unu n’okpuru ya, ọ bughi nání n’ihi iwe ahu, kama ọ bu kwa n’ihi akọ-na-uche.

6 N’ihi na ọ bu n’ihi nka ka unu nātu kwa ùtú; n’ihi na ha bu ndi nēfè Chineke òfùfè, nānọgidesi ike n’ọlu-ha ime otù ihe a.

7 Nākwughachinu madu nile ihe nile unu ji ha n’ugwọ: tunu ùtú nye onye unu ji ugwọ ùtú; tunu ùtú-ahia nye onye unu ji ugwọ ùtú-ahia; tuanu egwu onye unu ji ugwọ egwu; sọpurunu onye unu ji ugwọ nsọpuru.

8 Unu ejila onye ọ bula ugwọ ọ bula, ma-ọbughi ihurita onwe-unu n’anya: n’ihi na onye nāhu madu-ibe-ya n’anya edebezuwo iwu.

9 N’ihi na okwu a, Akwala iko, Eb͕ula madu, Ezula ori, Agu ihe ọjọ agula gi, ọ buru kwa na ihe ọ bula ọzọ di enyere n’iwu, achikọtara ya n’okwu a, bú, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n’anya dika onwe-gi.

10 Ihu-n’anya adighi-alu ọlu ọjọ n’ebe onye-ab͕ata-obi-ya nọ: ya mere ihu-n’anya bu idebezu iwu.

11 Nke ahu kwa, ebe unu matara oge a, na oge hour eruwo ub͕u a ka unu teta n’ura: n’ihi na ub͕u a nzọputa-ayi di nso kari mb͕e ayi kwere na mbu.

12 Chi ejimiwo, chi-ọbubọ di kwa nso: ya mere ka ayi yipu ọlu nile nke ọchichiri, ma ka ayi yikwasi ihe-agha nke ihè.

13 Ka ayi nējeghari dika ọ kwesiri ayi, dika n’ehihie; ọ bughi n’ite-egwú na iṅubiga-manya-ókè, ọ bughi n’ikwa-iko na agu ikwa-iko, ọ bughi n’esem-okwu na ekworo.

14 Kama yikwasinu Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, unu ebu-kwa-la uzọ nēchère aru, ime ihe ọjọ nāgu ya.

Categories
NDI ROM

NDI ROM 14

1 Ma kpọbatanu onye nādighi ike n’okwukwe-ya, ọ bughi ikpa ókè n’ihe ọ nātule n’obi.

2 Otù onye nwere okwukwe iri ihe nile: ma onye nādighi ike nēri nání ihe anāku n’ubi.

3 Ka onye nēri ihe ghara ikpọ onye nādighi-eri ihe-efu; ka onye nādighi-eri ghara kwa ikpe onye nēri ikpé: n’ihi na Chineke kpọbatara ya.

4 Gi onwe-gi nke nēkpe onye nējere onye ọzọ ozi, i bu onye? ọ bu n’ebe Onye-nwe ya onwe-ya nọ ka ọ nēguzo ma-ọbu nāda. Ma agēme ya ka o guzo; n’ihi na Onye-nwe-ayi puru ime ya ka o guzo.

5 Otù onye nārọputa otù ubọchi kari ubọchi ọzọ: ma onye ọzọ nārọputa ubọchi dum. Ka onye ọ bula nēkwezu nime uche nke aka ya.

6 Onye nātukwasi uche n’ubọchi, nātukwasi uche na ya n’ebe Onye-nwe-ayi nọ: onye nēri kwa, nēri n’ebe Onye-nwe-ayi nọ, n’ihi na ọ nēkele Chineke; onye nādighi-eri kwa, n’ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ọ nādighi-eri, ọ nēkele kwa Chineke.

7 N’ihi na ọ dighi onye ọ bula n’etiti ayi nke di ndu n’ebe ya onwe-ya nọ, ọ dighi kwa onye ọ bula nwuru anwu n’ebe ya onwe-ya nọ.

8 N’ihi na asi na ayi di ndu, ọ bu n’ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ayi di ndu; ma asi na ayi nwuru, ọ bu n’ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ayi nwuru: ya mere, ma ayi di ndu, ma ayi nwuru anwu, ayi bu ndi nke Onye-nwe-ayi.

9 N’ihi na ihe Kraist ji nwua, di kwa ndu ọzọ, bu nka, ka O we buru Onye-nwe ma ndi nwuru anwu ma ndi di ndu.

10 Ma gi onwe-gi, gini mere i nēkpe nwa-nna-gi ikpé? ma-ọbu gi onwe-gi kwa, gini mere i nākpọ, nwa-nna-gi ihe-efu? n’ihi na ayi nile gēguzo n’iru oche-ikpé Chineke.

11 N’ihi na edewo ya n’akwukwọ nsọ, si,

Dika Mu onwem nādi ndu, ka Onye-nwe-ayi kwuru, ọ bu Mu onwem ka ikperè nile ọ bula gēb͕uru,

Ire nile ọ bula gēkwuputa kwa Chineke.

12 Ya mere otú a onye ọ bula n’etiti ayi gāza ajuju bayere onwe-ya nye Chineke.

13 Ya mere ka ayi ghara ikperita ibe-ayi ikpé ọzọ: ma kama ya kpenu ikpé a, ka onye ọ bula ghara idebe ihe-isu-ngọngọ, ma-ọbu ọnyà, n’uzọ nwa-nna-ya.

14 Amataram, eme-kwa-ra ka m’kweye nime Onye-nwe-ayi Jisus, na ọ dighi ihe ruru árú site n’onwe-ya: ọ bu nání n’ebe ọ nọ, bú onye nāgu ihe ọ bula na ọ ruru árú, n’ebe onye ahu nọ ka ọ ruru árú.

15 N’ihi na asi na n’ihi ihe-oriri ọ nēwuta nwa-nna-gi, i dighi-ejeghari ọzọ dika ihu-n’anya si di. Ewela ihe-oriri-gi la onye ahu n’iyì, bú onye Kraist nwuru n’ihi ya.

16 Ya mere unu ekwela ka ekwulu ezi ihe-unu:

17 n’ihi na ala-eze Chineke abughi oriri na ọṅuṅu, kama ọ bu ezi omume na udo na ọṅù nime Mọ Nsọ.

18 N’ihi na onye nābu orù Kraist n’uzọ nka, ọ di Chineke ezi utọ, buru kwa onye anwaputara n’iru madu.

19 Ya mere otú a, ka ayi nāb͕aso ihe nile diri udo, na ihe nile diri iwulirita onwe-ayi elu dika ulo.

20 Akwatula ọlu Chineke n’ihi ihe-oriri. Ihe nile di ọcha n’ezie; ma ihe ọ bula buru madu ahu ihe ọjọ, onye were ihe-isu-ngọngọ nēri ya.

21 Ọ di nma ka i ghara iri anu, ma-ọbu iṅu manya-vine, ma-ọbu ime ihe ọ bula nke nwa-nna-gi gāsu ngọngọ nime ya.

22 Okwukwe ahu nke gi onwe-gi nwere, nwe ya n’onwe-gi n’iru Chineke. Ngọzi diri onye nēkpeghi onwe-ya ikpé n’ihe ọ nānwaputa.

23 Ma onye nwere obi abua, amawo ya ikpé ma o rie, n’ihi na o siteghi n’okwukwe rie; ma ihe ọ bula nke nēsiteghi n’okwukwe bu nmehie.

Categories
NDI ROM

NDI ROM 15

1 Ma ayi onwe-ayi, bú ndi nwere ike, ayi aghaghi ibū adighi-ike nile nke ndi nēnweghi ike, na ighara ime ihe nātọ onwe-ayi utọ.

2 Onye ọ bula n’etiti ayi, ya me ihe gātọ onye-ab͕ata-obi-ya utọ iwetara ya ezi ihe, ka ọ we wulie ya elu dika ulo.

3 N’ihi na Kraist-ayi emeghi kwa ihe tọrọ Onwe-ya utọ; kama, dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, Ita-uta nile nke ndi nāta Gi uta dakwasirim.

4 N’ihi na ka ha ra, bú ihe edere n’akwukwọ nsọ n’oge gara aga, edere ha izí ayi ihe, ka ayi we were ntachi-obi na nkasi-obi nke ihe nile edeworo n’akwukwọ nsọ nwe olile-anya.

5 Ma ka Chineke nke ntachi-obi na nke nkasi-obi nye unu ka unu tukwasi uche n’otù ihe ahu n’etiti-onwe-unu dika Kraist Jisus si chọ:

6 ka unu we ji otù obi ji kwa otù olu nēnye Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist otuto.

7 N’ihi ya nākpọbatanu ibe-unu, dika Kraist-ayi kpọbata-kwa-ra unu, ka ewe nye Chineke otuto.

8 N’ihi na asim na emewo Kraist ka Ọ buru onye nējere obibì-úgwù ozi n’ihi ezi-okwu Chineke, ka O we me ka nkwa nile ekwere nna-ayi-hà guzosie ike,

9 ka ndi mba ọzọ we nye kwa Chineke otuto n’ihi ebere-Ya; dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si,

N’ihi nka ka M’gēkwuputa Gi n’etiti mba nile,

Aha-Gi ka m’gābùku kwa abù ọma.

10 Ọzọ kwa Ọ si,

Unu mba ọzọ, soronu ndi-Ya nwe obi-utọ.

11 Ọzọ kwa,

Tonu Onye-nwe-ayi, unu mba nile;

Ka ndi nile di iche iche nāja kwa Ya.

12 Ọzọ kwa, Aisaia si,

Nkpọrọgwu ahu nke Jesi gādi,

Na onye ahu Nke nēbili ibu onye-isi mba nile;

Onye ahu ka ndi mba ọzọ gēle anya Ya.

13 Ma Chineke nke olile-anya ahu mejue unu n’ọṅù nile na udo nile n’ikwe-ekwe, ka unu we nwebiga olile-anya ahu ókè, n’ike Mọ Nsọ.

14 Ma emewom ka m’kweye, umu-nnam, ọbuná mu onwem, ihe bayere unu, na unu onwe-unu juputara n’idi-nma, na emejuwo kwa unu n’ihe-ọmuma nile, na unu pu-kwa-ra idurita onwe-unu ọdú.

15 Ma ejikaririm anya-ike degara unu akwukwọ n’otù akuku, dika ọ bu ichetara unu ọzọ, n’ihi amara nke Chineke nyerem,

16 ka m’we buru onye nēfè Kraist Jisus òfùfè ijekuru ndi mba ọzọ, nālu kwa ọlu onye-nchu-àjà nke ozi ọma Chineke, ka ewe me ka iche-ndi-mba-ọzọ-n’iru-Chineke buru ihe agānara nke-ọma, ebe edoro ya nsọ nime Mọ Nsọ.

17 Ya mere enwerem inya-isim nime Kraist Jisus n’ihe nile diri Chineke.

18 N’ihi na m’gaghi-enwe anya-ike ikwu ihe o bula ma-ọbughi n’ihe nile Kraist lutara site n’akam, ime ka ndi mba ọzọ ṅa nti, n’okwu na ọlu,

19 n’ike nke ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche, n’ike nke Mọ Nsọ; ya mere site na Jerusalem, na ala nke di ya gburugburu rue Ilirikọm, ezìzuwom ozi ọma Kraist;

20 ma nka ka m’mere nējisi ike izisa ozi ọma ahu otú a, ọ bughi ebe akpọrọri aha Kraist, ka m’ghara iwu ulo n’elu ntọ-ala onye ọzọ;

21 kama, dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ,

Ha gāhu, bú ndi akākọghi akukọ Ya mb͕e ọ bula,

Ndi akānughi kwa gāghọta.

22 N’ihi nka eb͕ochi-kwa-ram ọtutu oge ndia ibiakute unu:

23 ma ub͕u a, ebe m’nēnweghi ebe ọ bula n’akuku ndia ọzọ, ebe ibiakute unu nāgusikwam ike ọtutu arọ ndia gara aga,

24 mb͕e ọ bula m’gāga Spain (n’ihi na anamele anya na m’gēkiri unu mb͕e m’nāgabiga, anamele kwa anya na unu gēdupum n’ijem iga ebe ahu, ma ọ buru na afọ gēburu uzọ jum n’aru unu n’akuku ufọdu)

25 ma ub͕u a, ka m’kwuru, agam Jerusalem, ebe m’nējere ndi nsọ ozi.

26 N’ihi na ọ di Masedọnia na Akaia ezi nma inye ndi-ob͕eye n’etiti ndi nsọ nọ na Jerusalem ihe ufọdu ha gēnwekọ.

27 N’ihi na ọ di ha ezi nma; ha bu kwa ndi ji ndi ahu ugwọ. N’ihi na asi na ndi mba ọzọ nwekọrọ ihe Mọ Nsọ nke ha, ha ji kwa ugwọ ifè ha òfùfè n’ihe nke anu-aru.

28 Ya mere mb͕e m’mezusiri nka, ka-kwa-ra ha nkpuru a akàrà, m’gēsi na nke unu je Spain.

29 Ma amataram na, mb͕e m’biakutere unu, ọ bu nime ozuzù ngọzi nke Kraist ka m’gābia.

30 Ma, umu-nnam, ewerem Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, were kwa ihu-n’anya Mọ Nsọ, nāriọ unu, ka unu som nāb͕asi nb͕a ike n’ekpere unu nēkpere Chineke n’ihim;

31 Ka ewe dọputam n’aka ndi nēkweyeghi ekwenye ndi nọ na Judia, ka ije-ozim nke m’ji je Jerusalem we búru kwa ihe ndi nsọ gānara nke-ọma;

32 ka m’we biakute unu n’ọṅù site n’ọchichọ Chineke, ka mu na unu we zukọ kwa ike.

33 Ma ka Chineke nke udo nọyere unu nile. Amen.

Categories
NDI ROM

NDI ROM 16

1 Ma anameme ka unu mara Fibi nwa-nna-ayi nwanyi, onye nējere nzukọ Kraist nke di na Kenkrii ozi:

2 ka unu we nara ya nke-ọma nime Onye-nwe-ayi, dika o kwesiri ndi nsọ, ka unu nēguzo kwa ya nso iyere ya aka n’okwu ọ bula nkpà unu gākpa ya: n’ihi na ya onwe-ya aburuwo kwa onye nēguzoro ọtutu madu izọ ha, mu onwem kwa.

3 Kelenu Priska na Akwila ndi mu na ha nālukọ ọlu nime Kraist Jisus,

4 madu ndi tọb͕ọrọ olu nke aka ha n’ihi ndum; ndi ọ bughi nání mu onwem nēkele, kama nzukọ Kraist nile nke ndi mba ọzọ kwa:

5 kele-kwa-nu nzukọ Kraist nke di n’ulo-ha. Kelenu Epinetọs onye m’huru n’anya, onye bu nkpuru mbu nke Esia nye Kraist.

6 Kelenu Meri, n’ihi na ọ dọb͕uru onwe-ya n’ọlu n’ọtutu ihe nye unu.

7 Kelenu Andrọnaikọs na Junias, ndi-ikwum, ndi adọkọ-kwa-ra mu na ha n’agha, madu ndi amara aha-ha n’etiti ndi-ozi, ndi bu-kwa-ram uzọ bia nọ nime Kraist.

8 Kelenu Amplietọs, onye m’huru n’anya nime Onye-nwe-ayi.

9 Kelenu Uabenọs, onye ayi na ya nālukọ ọlu nime Kraist, na Stakis onye m’huru n’anya.

10 Kelenu Apelis onye anwaputaworo nime Kraist. Kelenu ndi sitere n’èzí-na-ulo nke Aristọbulọs.

11 Kelenu Hirọdion onye-ikwum. Kelenu ndi sitere n’èzi-na-ulo nke Nasisọs, ndi nọ nime Onye-nwe-ayi.

12 Kelenu Traifina na Traifosa ndi nādọb͕u onwe-ha n’ọlu nime Onye-nwe-ayi. Kelenu Pasis onye ahuru n’anya, n’ihi na ọ dọb͕uru onwe-ya n’ọlu n’ọtutu ihe nime Onye-nwe-ayi.

13 Kelenu Rufọs onye arọputara nime Onye-nwe-ayi, na nne-ya nke bu kwa nnem.

14 Kelenu Asinkritọs, Flegon, Hamis, Patrọbas, Hamas, na umu-nna ndi ha na ha nọ.

15 Kelenu Filọlọgọs na Julia, Nireọs na nwa-nne-ya nwayi, na Ọlimpas, na ndi nsọ nile ndi ha na ha nọ.

16 Werenu isutu-ọnu di nsọ kelerita onwe-unu. Nzukọ Kraist nile nēkele unu.

17 Ma anamariọ unu, umu-nnam, ka unu le ha anya, bú ndi nēweta nkewa di iche iche ahu na ọnyà di iche iche ahu, nēmegide ozizí nke unu onwe-unu mutara: ka unu nēze kwa ha.

18 N’ihi na ndi di otú a abughi orù nke Onye-nwe-ayi Kraist, kama orù nke afọ nke ha; ha were kwa okwu utọ ha na okwu ọma ha nāghọb͕u obi ndi nāmaghi ihe ọjọ.

19 N’ihi na iṅa-nti-unu eruzuwo na nti madu nile. Ya mere anamaṅuri ọṅu n’isi unu: ma anamachọ ka unu buru ndi-amam-ihe n’ebe ezi ihe di, ma ndi arughi-árú n’ebe ihe ọjọ di.

20 Ma Chineke nke udo gāzọpia Setan n’okpuru ukwu-unu ọsọsọ.

Amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu.

21 Timọti onye mu na ya nālukọ ọlu nēkele unu; na Lusiọs na Jeson na Sosipata, ndi-ikwum.

22 Mu onwem, bú Tatiọs, onye nēde akwukwọ-ozi a, nēkele unu nime Onye-nwe-ayi.

23 Gaiọs, onye nēlem na nzukọ Kraist dum ọbìa, nēkele unu. Erastọs onye nāchi ihe obodo nēkele unu, na Kwọtọs nwa-nna-ayi.

24 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu nile. Amen.

25 Ma Onye ahu Nke puru ime ka unu guzosie ike dika ozi ọmam na nkwusa nke Jisus Kraist si di, dika nkpughe nke ihe-omimi ahu si di nke emeworo ka o kpuchie ọnu n’oge ebighi-ebi,

26 ma ub͕u a ka emere ka ọ puta ìhè, esite kwa n’ihe ndi-amuma deworo n’akwukwọ me ka mba nile mara ya, dika ihe Chineke ebighi-ebi nyere n’iwu si di, rue iṅa-nti nke okwukwe;

27 Chineke Nke nání Ya bu Onye-amam-ihe, site n’aka Jisus Kraist, Onye otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.