Categories
NDI ROM

NDI ROM 1

1 Pọl, orù nke Jisus Kraist, onye akpọrọ ibu onye-ozi, onye ekewapuru nye ozi ọma Chineke,

2 nke O buru uzọ kwere na nkwa site n’ọnu ndi-amuma-Ya n’ihe nile edeworo n’akwukwọ nsọ,

3 bayere Okpara-Ya, Onye amuru site na nkpuru Devid dika anu-aru si di,

4 Onye akaworo ibu Ọkpara Chineke n’ike, dika Mọ nke idi-nsọ si di, site na nbilite-n’ọnwu nke ndi nwuru anwu; bú Jisus Kraist Onye-nwe-ayi,

5 Onye ayi sitere n’aka-Ya nata amara na ọlu onye-ozi, rue iṅa-nti nke okwukwe n’etiti mba nile, n’ihi aha-Ya:

6 ndi unu onwe-unu nọ kwa n’etiti ha, ndi akpọrọ ibu ndi nke Jisus Kraist:

7 Pọl nka nēdegara ndi nile nọ na Rom akwukwọ, bú ndi Chineke huru n’anya, ndi akpọrọ ibu ndi nsọ: Amara diri unu na udo nke si n’aka Chineke Nna-ayi na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist bia.

8 Mbu, anamekele Chinekem ekele site na Jisus Kraist bayere unu nile, na anēkwusa okwukwe-unu n’uwa dum.

9 N’ihi na Chineke, Onye m’nēkpere nime mọm n’ozi ọma nke Ọkpara-Ya, bu Onye-àmàm, otú m’nārapughi aka n’ihota unu,

10 nāriọ aririọ mb͕e nile n’ekperem nile, ọ buru na, ma eleghi anya, ub͕u a n’oge a ezi uzọ gādirim ibiakute unu, n’ihe Chineke nāchọ.

11 N’ihi na ihu unu anya nāgusim ike, ka m’kwe ka unu keta onyinye-amara ufọdu nke Mọ Nsọ, ka ewe me ka unu guzosie ike;

12 nke ahu bu, ka ewe kasie mu na unu obi n’etiti unu, site n’okwukwe ayi kwekọrọ, ma nke unu ma nke mu onwem.

13 Ma achọghi m ka unu ghara imara, umu-nnam, na ọtutu mb͕e m’zubere ibiakute unu (eb͕ochi-kwa-ram ibia rue ub͕u a), ka m’we nwe kwa nkpuru ufọdu n’etiti unu, dika ọ di kwa n’etiti ndi mba ọzọ fọduru.

14 Ejim madu nile ugwọ, ma ndi-Grik ma ndi nāsu asusu ọzọ, ma ndi mara ihe ma ndi nēnweghi uche.

15 Otú a, ka ihe bayere mu onwem ra, ọ dim ọku n’obi izì kwa unu ndi bi na Rom ozi ọma.

16 N’ihi na ihere ozi ọma ahu adighi-emem: n’ihi na ọ bu ike nke Chineke rue nzọputa nye onye ọ bula nke kwere; onye-Ju na mbu, na onye-Grik kwa.

17 N’ihi na anēkpughe ezi omume Chineke nime ya, site n’okwukwe rue okwukwe: dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si, Ma onye ezi omume gēsite n’okwukwe di ndu.

18 N’ihi na esi n’elu-igwe kpughe iwe Chineke imegide asọpurughi-Chineke na ajọ omume nile nke madu, ndi nēb͕ochi ezi-okwu n’ajọ omume;

19 n’ihi na ihe apuru imata bayere Chineke nāputa ìhè nime ha; n’ihi na Chineke mere ka ọ putara ha ìhè.

20 N’ihi na ihe-Ya anya nāhughi site n’òkìkè uwa ka anāhu nke-ọma, ebe anāghọta ha site n’ihe nile ekère èkè, bú ike ebighi-ebi Ya na udi-Chineke-Ya; ka ha ghara inwe ngọpu:

21 n’ihi na, ọ bu ezie na ha mara Chineke, ma ha enyeghi Ya otuto dika Chineke, ha ekeleghi kwa Ya; kama emere ha ihe-efu n’ihe nile ha nātule n’obi-ha, obi-ha nke nēnweghi nghọta b͕a-kwa-ra ọchichiri.

22 Mb͕e ha nēkwu na ha bu ndi mara ihe, ha we ghọ ndi-nzuzu,

23 we were ebube nke Chineke anāpughi imebi b͕anwere oyiyi nke onyinyo madu apuru imebi, na nke anu-ufe na anu ukwu anọ na ihe nākpu akpu di iche iche.

24 N’ihi ya Chineke rara ha nye n’aka adighi-ọcha n’ihe ọjọ nile nāgu obi-ha, ka ewe me aru-ha ihe-ihere n’etiti ha:

25 ebe ha were ezi-okwu nke Chineke b͕anwere ugha-ha, ha we sọpuru nēkpe-kwa-ra ihe ekère èkè kama Onye kère èkè, Onye agọziworo ebighi-ebi. Amen.

26 N’ihi nka Chineke rara ha nye n’aka agu ihe-ihere: n’ihi na ndinyom-ha were nwanyi ha bu site n’ọmumu b͕anwere ihe nēmegide ka esi mu ha:

27 otú a ndikom rapu-kwa-ra otú anēme nwanyi site ka esi mu ya, we re ọku n’agu-ha n’aru ndikom-ibe-ha, ndikom nāluputa ihe nādighi nma n’anya n’aru ndikom, nānara kwa nime onwe-ha ugwọ-ọlu ahu nke njehie-ha nke ha nāghaghi inara.

28 Dika ha juru inọgide n’imazu Chineke, Chineke ra-kwa-ra ha nye n’aka uche ajuru aju, ime ihe ahu nile nēkwesighi;

29 ebe ha juputara n’ajọ omume nile, ajọ ọlu, anya-uku, obi ọjọ; juputa kwa n’ekworo, ob͕ub͕u-madu, esem-okwu, aghughọ, uche ọjọ; ndi-ntakwu,

30 ndi nēkwutọ madu, ndi nākpọ Chineke asì, ndi nēme madu ihe-ihere, ndi-npako, ndi nānya isi, ndi nāchọputa ihe ọjọ, ndi nēkweyeghi ndi muru ha,

31 Ndi nēnweghi nghọta, ndi nēmebi ọb͕ub͕a-ndu, ndi ihe madu-ibe-ha nādighi-atọ utọ, ndi nēnweghi obi-ebere:

32 madu ndi, ọ bu ezie na ha mazuru ihe Chineke guru n’ihe ziri ezi, na ndi nēme ihe di otú a kwesiri ọnwu, ma ọ bughi nání na ha nēme ha, kama ndi nēme ha di kwa ha ezi nma.

Categories
NDI ROM

NDI ROM 2

1 N’ihi ya i nweghi ngọpu, gi madu, onye ọ bula nēkpe ikpé: n’ihi na i nāma onwe-gi ikpe n’ihe i nēkpe madu-ibe-gi; n’ihi na gi onye nēkpe ikpe nēme otù ihe ahu.

2 Ayi ma-kwa-ra na ikpé Chineke di ka ezi-okwu si di imegide ndi nēme ihe di otú a.

3 Ma ì nāgu nka, gi madu, nke nēkpe ndi nēme ihe di otú a, ma i nēme kwa ha, na gi onwe-gi gāb͕anari ikpé Chineke?

4 Ma-ọbu ì nēlelì àkù nke obi-ọma-Ya na nke nnagide-Ya na nke ogologo-ntachi-obi-Ya, ebe i nāmaghi na ọlu obi-ọma Chineke nēdubà gi na nchèghari?

5 ma dika obi-etili-gi na obi-gi nēchègharighi si di i nākpado iwe nye onwe-gi n’ubọchi iwe na nkpughe nke ikpé ziri ezi nke Chineke;

6 Onye gēnyeghachi onye ọ bula dika ọlu-ya nile si di:

7 ndi site na ntachi-obi n’ezi ọlu nāchọ otuto na nsọpuru na apughi-imebi ka Ọ gēnye ndu ebighi-ebi:

8 ma ndi di n’akuku nke ikpa-iche-iche, ndi nēkweyeghi kwa ezi-okwu, kama ha nēkweye ajọ omume, iwe na ọnuma,

9 nkpab͕u na oké nkpà, gādiri ha, n’elu nkpuru-obi ọ bula nke madu onye nāluputa ihe ọjọ, nke onye-Ju na mbu, na nke onye-Grik kwa;

10 ma otuto na nsọpuru na udo gādiri onye ọ bula nke nālu ezi ọlu, onye-Ju na mbu, na onye-Grik kwa:

11 n’ihi na ile-madu-anya-n’iru adighi n’ebe Chineke nọ.

12 N’ihi na ka ha ra, bú ndi mehiere nēnweghi iwu, ha gāla kwa n’iyì nēnweghi iwu: ka ha ra kwa, bú ndi mehiere n’okpuru iwu, agēsite n’iwu kpe ha ikpé;

13 n’ihi na ọ bughi ndi nānu iwu bu ndi ezi omume n’ebe Chineke nọ, kama ọ bu ndi nēdebe iwu ka agāgu na ndi ezi omume:

14 n’ihi na mb͕e ọ bula ndi mba ọzọ ndi nēnweghi iwu nēme ihe nile di n’iwu site ka esi mu ha, ndi ahu, ọ bu ezie na ha enweghi iwu, ma ha onwe-ha bu iwu enyere onwe-ha;

15 n’ihi na ha nēgosi ọlu iwu na edewo ya n’obi-ha, akọ-na-uche-ha nēso kwa ya nāb͕a àmà, ihe ha nātule n’obi-ha n’etiti onwe-ha nēbo kwa ha ebubo ma-ọbu ma eleghi anya nāgọpu ha;

16 n’ubọchi ahu mb͕e Chineke gēkpe ihe-nzuzo nile nke madu nile, dika ozi ọma m si di, site n’aka Jisus Kraist.

17 Ma ọ buru na akpọrọ gi onwe-gi aha onye-Ju, ọ buru kwa na i nēzu ike n’elu iwu, nānya kwa isi na Chineke,

18 nāma kwa ihe Ọ nāchọ, nānwa kwa ihe ha na ibe-ha di iche, ebe anēwere okwu-ọnu zí gi ihe site n’iwu-gi,

19 ọ buru kwa na eme ka i kweye na gi onwe-gi bu onye-ndú nke ndi-ìsì, ìhè nke ndi nọ n’ọchichiri,

20 onye nāzùputa ndi nēnweghi uche, onye-ozizí nke umu ọhu, ebe i nēnwe udi nke ihe-ọmuma na nke ezi-okwu n’iwu ahu;

21 ya mere gi onye nēzí madu-ibe-gi ihe, ì dighi-ezí onwe-gi? gi onye nēkwusa ka madu ghara izu ori, ì nēzu ori?

22 gi onye nāsi ka madu ghara ikwa iko, ì nākwa iko? gi onye nākpọ arusi ihe-árú, ì nēzu ihe ulo chi ori?

23 gi onye nānya isi n’iwu, ì nēme Chineke ihe-ihere site na njehie-gi n’iwu ahu?

24 N’ihi na anēkwulu aha Chineke n’etiti ndi mba ọzọ n’ihi unu, dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ.

25 N’ihi na obibì-úgwù nāba urù ezie, ma ọ buru na i nēdebe iwu: ma ọ buru na i bu onye-njehie n’iwu, obibì-úgwù-gi aghọwo ebìghi-úgwù.

26 Ya mere ọ buru na onye ebìghi-úgwù nēdebe ihe nile iwu-gi guru n’ihe ziri ezi, àgaghi-agu ebìghi-úgwù-ya n’obibì-úgwù?

27 onye ebìghi-úgwù ka esi mu ya, ma ọ buru na ọ debezu iwu, ọ̀ gaghi-ekpe kwa gi ikpé, onye sitere n’ihe edeworo n’akwukwọ na obibì-úgwù bu onye-njehie n’iwu?

28 N’ihi na onye nke bu onye-Ju n’anya madu abughi onye-Ju; obibì-úgwù ahu nke madu nāhu anya, nke di n’anu-aru, abughi kwa obibì-úgwù:

29 kama onye nke bu onye-Ju n’ihe zoro ezo, onye ahu bu onye-Ju; obibì-úgwù bu kwa nke nkpuru-obi, nime mọ, ọ bughi n’ihe edeworo n’akwukwọ; nke otuto-ya nēsiteghi n’aka madu, kama o sitere n’aka Chineke.

Categories
NDI ROM

NDI ROM 3

1 Gini kwa ka onye-Ju nwebigara ókè? ma-ọbu ùrù gini ka ibì-úgwù bara?

2 Ọ bara urù ri nne n’uzọ nile: mbu, na ewere okwu si n’ọnu Chineke puta nye ha n’aka na ntukwasi-obi.

3 N’ihi na asi na ufọdu ekweghi, gini kwa? èkweghi-ekwe-ha gēme ka ikwesi-ntukwasi-obi nke Chineke ghara idi irè?

4 Chineke ekwela: kama ka ọ puta ihè na Chineke bu Onye ezi-okwu, ma madu nile n’otù n’otù bu ndi-ugha; dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si,

Ka ewe gua Gi n’onye ezi omume n’okwu-Gi nile,

Ka I we kpeb͕u kwa mb͕e anēkpe Gi ikpé.

5 Ma ọ buru na ajọ omume-ayi eme ka ezi omume Chineke puta ìhè, gini ka ayi gēkwu? Chineke, Onye nēme ka iwe-Ya dakwasi ayi, Ọ̀ bu onye ajọ omume? (Anamekwu dika madu.)

6 Chineke ekwela: n’ihi na Chineke gēsi kwa aṅa kpe uwa ikpé?

7 Ma ọ buru na ezi-okwu nke Chineke babigara uba ókè n’iwetara Ya ebube site n’okwu-ugha nkem, gini mere anēkpe kwa mu onwem ikpé ọzọ dika onye-nmehie?

8 gini me-kwa-ra ayi asighi, Ka ayi me ihe ọjọ, ka ezi ihe we puta? (dika anēkwulu ayi, dika ufọdu nēkwu kwa na ayi nāsi), ndi ikpé-ha ziri ezi.

9 Gini kwa? àyi ka ha nma? É-è, ayi akaghi ha nma ma-ọli: n’ihi na ayi buru uzọ bo ndi-Ju bo kwa ndi-Grik ebubo, na ha nile nọ n’okpuru nmehie;

10 dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si,

Ọ dighi onye bu onye ezi omume, ọ dighi otù onye ma-ọli;

11 Ọ dighi onye nāghọta,

Ọ dighi onye nāchọ Chineke;

12 Ha nile ewezugawo onwe-ha, ha nile abaghi n’ihe n’otù;

Ọ dighi onye nēme ihe ọma, ọ dighi ọbuná otù onye:

13 Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu;

Ha jiri ire-ha ghọ aghughọ:

Edide aju-ala di n’okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha:

14 Ndi ọnu-ha juru n’ọb͕ub͕a-iyi na ihe-ilu:

15 Ukwu-ha di ngwa iwusì ọbara;

16 Nbibi na ihuju-anya di n’uzọ nile ha;

17 Uzọ udo ka ha nāmaghi kwa:

18 Egwù Chineke adighi n’anya-ha.

19 Ma ayi matara na ka ha ra, bú ihe iwu Chineke nēkwu, ọ nāgwa ndi nọ n’okpuru iwu ahu; ka ewe kpuchita ọnu nile n’otù n’otù, ka ewe kwe na ikpé mara uwa nile n’ebe Chineke nọ:

20 n’ihi na site n’ọlu nile nke iwu ọ dighi madu ọ bula agāgu n’onye ezi omume n’iru Ya: n’ihi na ọ bu n’aka iwu ka nmazu nke nmehie sitere.

21 Ma ub͕u a emewo ka ezi omume Chineke puta ìhè nke nēguzo iche n’ebe iwu di, nke iwu ahu na ndi-amuma nāb͕ara ya àmà;

22 ma ọ bu ezi omume Chineke, site n’okwukwe ekwere na Jisus Kraist, nke diri ndi nile kwere: n’ihi na ọ dighi ihe di iche;

23 n’ihi na madu nile emehiewo, ha adighi-eru kwa otuto Chineke;

24 anēwere kwa amara-Ya nāgu ha na ndi ezi omume n’onyinye efu site na nb͕aputa ahu nke di nime Kraist Jisus:

25 Onye Chineke chere n’iru ọra madu ka Ọ buru ihe ijuru Ya obi, site n’okwukwe ekwere n’ọbara-Ya, igosi ezi omume-Ya, n’ihi nb͕aghara nmehie nile emehiereri n’oge gara aga, n’oge nnagide nke Chineke;

26 ka O we gosi ezi omume-Ya n’oge di ub͕u a, ka m’kwuru: ka Ya onwe-ya we buru onye ezi omume, buru kwa onye nāgu onye ahu n’onye ezi omume, bú onye nọ n’okwukwe ekwere na Jisus.

27 Òle ebe inya-isi-ayi di kwa? Emechibidowo ya n’èzi. Sìte n’aha iwu gini? ọ̀ bu nke ọlu? É-è: kama ọ bu site n’iwu nke okwukwe.

28 Ya mere ayi guru na anāgu madu n’onye ezi omume site n’okwukwe, mb͕e ọ kālughi ọlu iwu.

29 Ma-ọbu Chineke, Ọ̀ bu Chineke nke nání ndi-Ju? Ọ̀ bughi kwa Chineke nke ndi mba ọzọ? E, ọ bu kwa nke ndi mba ọzọ:

30 asi na ọ bu ezie na Chineke bu otù, Onye gāgu ndi obibì-úgwù na ndi ezi omume site n’okwukwe, were kwa okwukwe ahu gua ndi ebìghi-úgwù na ndi ezi omume.

31 Àyi nēsite kwa n’okwukwe-ayi me ka iwu ghara idi irè? Chineke ekwela: kama ayi nēme ka iwu guzo.

Categories
NDI ROM

NDI ROM 4

1 Gini kwa ka ayi gēkwu na Abraham huworo, bú nna-ayi ochie dika anu-aru si di?

2 N’ihi na asi na aguru Abraham n’onye ezi omume site n’ọlu, o nwere ihe inya isi; ma ọ bughi n’ebe Chineke nọ.

3 N’ihi na ọ̀ bu gini ka ihe edeworo n’akwukwọ nsọ nēkwu? Abraham we kwere Chineke, ewe gua nke ahu nye ya dika ezi omume.

4 Ma onye nālu ọlu, agughi ugwọ-ọlu-ya nye ya dika amara, kama dika ugwọ.

5 Ma onye nālughi ọlu, kama ọ kwere n’Onye ahu Nke nāgu onye nāsọpughi Chineke n’onye ezi omume, anāgu okwukwe-ya nye ya dika ezi omume.

6 Ọbuná dika Devid nāsi kwa na madu ahu bu onye ngọzi diri, bú onye Chineke nāgu ezi omume nye ya mb͕e ọ kālughi ọlu,

7 si,

Ngọzi nādiri ndi ab͕aghara nmebì-iwu nile ha,

Ndi ekpuchi-kwa-ra nmehie nile ha.

8 Ngọzi nādiri nwoke ahu onye Onye-nwe-ayi nāgaghi-agu nmehie nye ya.

9 Ọ̀ bu kwa ndi obibì-úgwù ka anākpọ ndi ngọzi a diri, ma-ọbu kwa ndi ebìghi-úgwù? n’ihi na ayi nāsi, Aguru okwukwe Abraham nye ya dika ezi omume.

10 Èsi kwa aṅa gu ya? àguru ya nye ya mb͕e ọ nọ n’obibì-úgwù, ma-ọbu mb͕e ọ nọ n’ebìghi-úgwù? Ọ bughi n’obibì-úgwù, kama ọ bu n’ebìghi-úgwù:

11 ọ we nara ihe-iriba-ama nke bu obibì-úgwù, bú akàrà nke ezi omume nke okwukwe ahu nke di n’ebìghi-úgwù-ya: ka o we buru nna nke ndi nile kwere, ọ bu ezie na ha nọ n’ebìghi-úgwù, ka ewe gua ezi omume nye ha;

12 ka o we buru kwa nna nke obibì-úgwù n’ebe ndi ahu nọ, bú ndi nābughi nání ndi sitere n’obibì-úgwù, kama ha nēsozi kwa ije-ukwu nke okwukwe ahu nke nna-ayi Abraham, nke o nwere n’ebìghi-úgwù.

13 N’ihi na esiteghi n’iwu kwere Abraham ma-ọbu nkpuru-ya nkwa, na ọ gābu onye-nketa nke uwa, kama o sitere n’ezi omume nke okwukwe.

14 N’ihi na asi na ndi ahu ndi sitere n’iwu bu ndi-nketa, emewo okwukwe ka ọ buru ihe-efu, me kwa nkwa ahu ka ọ ghara idi irè:

15 n’ihi na iwu ahu nāluta iwe; ma ebe iwu nādighi, njehie adighi kwa.

16 N’ihi nka o sitere n’okwukwe, ka o we di ka amara si di; ka nkwa ahu we guzosie ike n’ebe nkpuru ahu nile nọ; ọ bughi nání ndi sitere n’iwu ahu, kama ọ bu kwa ndi sitere n’okwukwe Abraham, onye bu nna nke ayi nile.

17 (dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si, Nna nke ọtutu mba ka M’meworo gi,) n’iru Onye o kwere, bú Chineke, Onye nēme ndi nwuru anwu ka ha di ndu, Onye nākpọ kwa ihe nādighi, dika asi na ha di.

18 Onye kwere mb͕e ọ gasiri oge olile-anya, ebe ọ dabere n’olile-anya, ka o we ghọ nna ọtutu mba, dika ihe ekwururi si di, Otú a ka nkpuru-gi gādi.

19 O we tugharia uche n’aru nke onwe-ya nke nwuwori, (ebe ọ b͕ara ihe di ka ọgu arọ ise), tughari kwa uche n’àkpà-nwa Sera na ọ bu ihe nwuru anwu, ma emeghi ya ka ọ ghara idi ike n’okwukwe-ya:

20 o jighi kwa ekweghi-ekwe nwe obi abua n’ebe nkwa Chineke di, kama ejiri okwukwe-ya me ka o nwe ike, ọ nēnye kwa Chineke otuto,

21 nēkwezu kwa na ihe O kwereri na nkwa, Ọ puru ime kwa.

22 N’ihi ya agu-kwa-ra ya nye ya dika ezi omume.

23 Ma ọ bughi n’ihi nání ya ka edeworo ya n’akwukwọ nsọ, na aguru ya nye ya;

24 kama ọ bu kwa n’ihi ayi, ndi agaje igu ya nye ayi, ndi kwere n’Onye ahu Nke mere ka Jisus Onye-nwe-ayi si na ndi nwuru anwu bilie,

25 Onye arara Ya nye n’ihi ndahie-ayi nile, ewe me ka O si n’ọnwu bilie n’ihi igu ayi na ndi ezi omume.

Categories
NDI ROM

NDI ROM 5

1 Ya mere ebe aguru ayi na ndi ezi omume site n’okwukwe, ayi na Chineke di n’udo site n’aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist;

2 Onye ayi sitewo-kwa-ra n’aka-Ya nwe nkpọbata-ayi n’okwukwe-ayi nime amara nka ayi nēguzo nime ya; ayi nānya kwa isi, nādabere n’olile-anya nke otuto Chineke.

3 Ma ọ bughi nání nka, kama ayi nānya kwa isi nime nkpab͕u-ayi nile: ebe ayi matara na nkpab͕u nāluta ntachi-obi;

4 ntachi-obi ahu nāluta kwa ọnwunwa; ọnwunwa ahu nāluta kwa olile-anya:

5 Olile-anya ahu emeghi kwa ka ihere me ayi; n’ihi na awusaworo ihu-n’anya nke Chineke n’obi-ayi site n’aka Mọ Nsọ Nke enyere ayi.

6 N’ihi na mb͕e ayi nọ nādighi ike, mb͕e oge-Ya ruru Kraist nwuru n’ihi ndi nādighi-asọpuru Chineke.

7 N’ihi na ọ di ike na otù onye gānwu n’ihi onye ezi omume: n’ihi na ma eleghi anya otù onye gēnwe anya-ike ọbuná inwu n’ihi ezi madu.

8 Ma Chineke nēme ka ihu-n’anya nke aka Ya n’ebe ayi nọ puta ìhè, n’ihi na, mb͕e ayi nọ nābu ndi-nmehie, Kraist nwuru n’ihi ayi.

9 Ya mere nke kariri ri nne, ebe agusiri ayi na ndi ezi omume ub͕u a nime ọbara-Ya, agāzọputa ayi n’iwe Chineke site n’aka-Ya.

10 N’ihi na asi na, mb͕e ayi bu ndi-iro, esitere n’ọnwu Ọkpara-Ya me ka ayi na Chineke di n’otù: nke kariri ri nne bu, ebe emesiri ka ayi na Chineke di n’otù, na agāzọputa ayi nime ndu-Ya;

11 ma ọ bughi nání nka, kama ayi nānya kwa isi na Chineke site n’aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye ayi siworo n’aka-Ya nata ime-ka-adi-n’otù a ub͕u a.

12 N’ihi nka, dika nmehie si n’aka otú madu ba n’uwa, dika ọnwu si n’aka nmehie ba kwa; ọnwu we si otú a gabiga rue madu nile, n’ihi na madu nile mehiere:

13 n’ihi na rue mb͕e iwu biara nmehie di n’uwa: ma adighi-agu nmehie mb͕e iwu nādighi.

14 Otú ọ di, ọnwu si n’oge Adam buru eze rue oge Moses, ọbuná ichiri ndi nēmehieghi n’oyiyi nke njehie Adam, onye bu ihe-atù nke Onye ahu gaje ibia.

15 Ma dika ndahie ahu si di, ọ bughi otú a ka onyinye-amara si di kwa. N’ihi na asi na ọra madu nwuru site na ndahie nke otù onye ahu, amara Chineke, na onyinye ahu nke di nime amara nke otù Madu ahu, Jisus Kraist, babigara ókè kari ri nne rue ọra madu.

16 Onyinye ahu abughi kwa dika o sitere n’aka otù onye nke mehiere: n’ihi na ikpé sitere n’otù onye bia weta amam-ikpe, ma onyinye-amara ahu sitere n’ọtutu ndahie bia weta ọlu igu madu na ndi ezi omume.

17 N’ihi na asi na ọnwu si n’aka otù onye ahu buru eze, site na ndahie nke otù onye ahu; ndi nānata nbabiga-ókè nke amara ahu na nke onyinye ahu, bú ezi omume, gābu kari eze ri nne na ndu site n’aka otù Onye ahu, bú Jisus Kraist.

18 Ya mere otú a, dika ikpé ahu sitere n’otù ndahie bia rue madu nile iwetara ha amam-ikpe; ọbuná otú a ka onyinye-amara ahu sitere n’otù ọlu ezi omume bia rue madu nile igu ha na ndi ezi omume ka ha nata ndu.

19 N’ihi na dika edoro ọra madu na ndi-nmehie site n’aṅaghi-nti nke otù madu ahu, ọbuná otú a ka agēdo ọra madu na ndi ezi omume site n’iṅa-nti nke otù Onye ahu.

20 Iwu we b͕ebà, ka ndahie ahu we rie nne; ma n’ebe nmehie riri nne, n’ebe ahu ka amara babigara ókè nke-uku kari:

21 ma, dika nmehie si buru eze n’onwu, ka amara we buru kwa eze otú a site n’ezi omume rue ndu ebighi-ebi site n’aka Jisus Kraist Onye-nwe-ayi.

Categories
NDI ROM

NDI ROM 6

1 Gini ka ayi gēkwu kwa? Àyi gānọgide na nmehie, ka amara we rie nne?

2 Chineke ekwela. Ayi onwe-ayi, bú ndi nwuru n’ebe nmehie di, àyi gēsi aṅa nādi ndu ọzọ nime ya?

3 Ma-ọbu ùnu amaghi na ka ayi-ra, bú ndi emere baptism iba nime Kraist Jisus, emere ayi baptism ibà n’ọnwu-Ya?

4 Ya mere esitere na baptism-ayi likọ ayi na Ya ibà n’ọnwu ahu: ka, dika esitere n’ebube nke Nna-Ya me ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, ka ayi onwe-ayi we jeghari kwa na ndu ọhu otú a.

5 N’ihi na asi na ejiri oyiyi ọnwu-Ya me ka ayi na Ya tokọ buru otù ihe, agēji kwa oyiyi nke nbilite-n’ọnwu-Ya me ka ayi na Ya tokọ buru otù ihe;

6 ebe ayi mara nka, na akpọgidekọrọ Ya na madu ochie ayi n’obe, ka ewe me ka aru-ayi nke nmehie nwezu ghara idi irè, ka ayi we ghara idi nābu orù nke nmehie ọzọ;

7 n’ihi na onye nwuru anwu, aguwo ya o’nye ezi omume pua na nmehie-ya.

8 Ma ọ buru na ayi na Kraist nwukọrọ, ayi kwere na ayi na Ya gādikọ kwa ndu ọzọ;

9 n’ihi na ayi matara na ebe emere ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie Ọ gaghi-anwu ọzọ; ọnwu abughi kwa onye nēnwe Ya ọzọ.

10 N’ihi na ọnwu Ọ nwuru, Ọ nwuru nání otù ọnwu n’ebe nmehie di: ma ndu Ọ nādi, Ọ nādi n’ebe Chineke nọ.

11 Otú a unu onwe-unu, nāgu-kwa-nu na unu onwe-unu bu ndi nwuru anwu n’ebe nmehie di, ma na unu nādi ndu nime Kraist Jisus n’ebe Chineke nọ.

12 Ya mere, ka nmehie ghara idi nābu eze n’aru-unu nke puru inwu anwu, ime unu ka unu ṅa agu-ya nile nti:

13 unu adi-kwa-la nēche ihe di unu n’aru n’iru nmehie ka ha buru ihe-agha ajọ omume; kama chenu onwe-unu n’iru Chineke, dika ndi sitere na ndi nwuru anwu di ndu, che-kwa-nu ihe di unu n’aru n’iru Chineke ka ha buru ihe-agha ezi omume.

14 N’ihi na nmehie agaghi-abu onye-nwe-unu: n’ihi na unu anọghi n’okpuru iwu, kama n’okpuru amara.

15 Gini kwa? ọ̀ bu na ayi gēmehie, n’ihi na ayi anọghi n’okpuru iwu, kama n’okpuru amara? Chineke ekwela.

16 Ùnu amataghi na onye unu nēche onwe-unu n’iru ya ka unu buru ndi-orù iṅa ya nti, unu bu ndi-orù nke onye ahu unu nāṅa nti ya; ma-ọbu nke nmehie nēweta ọnwu, ma-ọ̀bu nke iṅa-nti nēweta ezi omume?

17 Ma ekele diri Chineke, na unu buri ndi-orù nke nmehie, ma unu sitere n’obi-unu ṅa nti ihe-atù nke ozizi ahu nke arara unu nye n’aka-ya;

18 ebe eme-kwa-ra ka unu pua na nmehie nwere onwe-unu, unu ghọrọ ndi-orù nke ezi omume.

19 Anamekwu dika madu n’ihi adighi-ike nke anu-aru-unu: n’ihi na dika unu chere ihe nile di unu n’aru n’iru adighi-ọcha na n’iru imebi-iwu nēdubà n’imebi-iwu ka unu buru ndi-orù-ha, otú a chenu ihe nile di unu n’aru n’iru ezi omume ub͕u a, bú nke nēdubà n’ido-nsọ, ka unu buru ndi-orù-ya.

20 N’ihi na mb͕e unu bu ndi-orù nke nmehie, unu nwere onwe-unu n’ebe ezi omume di.

21 Ọ̀ bu nkpuru gini kwa ka unu nwere n’oge ahu n’ihe nile ahu nke ihere ha nēme unu ub͕u a? n’ihi na ọgwugwu ihe nile ahu bu ọnwu.

22 Ma ub͕u a ebe unu pusiri na nmehie nwere onwe-unu, ghọ kwa ndi-orù nke Chineke, unu nwere nkpuru-unu nēweta ido-nsọ, unu nwe-kwa-ra ndu ebighi-ebi dika ọgwugwu-ya.

23 N’ihi na ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu; ma onyinye-amara nke Chineke bu ndu ebighi-ebi nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.

Categories
NDI ROM

NDI ROM 7

1 Ma-ọbu ùnu amaghi, umu-nnam (n’ihi na anamagwa ndi mara iwu okwu), na iwu bu onye-nwe madu ka oge ra ọ nādi ndu?

2 N’ihi na iwu kekọrọ nwanyi nke nwere di n’aru di-ya mb͕e di-ya nọ na ndu; ma ọ buru na di-ya nwuru, atọpuwo ya n’iwu nke di-ya.

3 Ya mere otú a, agākpọ ya nwanyi nākwa iko, ma ọ buru na ọ lakuru nwoke di iche mb͕e di-ya nọ na ndu: ma ọ buru na di-ya nwuru, ọ puwo n’iwu nwere onwe-ya, nke nēme ya ka ọ ghara ibu nwanyi nākwa iko, ma ọ buru na ọ lakuru nwoke di iche.

4 Ya mere, umu-nnam, esite-kwa-ra n’aru Kraist me ka unu onwe-unu nwua n’ebe iwu di; ka unu we lakuru di di iche, bú Onye emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ka ayi we miara Chineke nkpuru.

5 N’ihi na mb͕e ayi nọ n’anu-aru, ọchichọ ọjọ nile nke diri nmehie nile ayi, nke sitere n’aka iwu ahu, nālusi ọlu ike n’ihe nile di ayi n’aru imiri ọnwu nkpuru.

6 Ma ub͕u a atọpuwo ayi n’iwu ahu, ebe ayi nwuru n’ebe ihe ahu di nke ejidesiri ayi ike nime ya; ya mere ayi nābu orù n’idi-ọhu nke Mọ Nsọ, ọ bughi kwa n’idi-ochie nke ihe edeworo n’akwukwọ.

7 Gini ka ayi gēkwu kwa? Ìwu ahu bu nmehie? Chineke ekwela. Kama, m’gaghi-amawori nmehie, ma ọ buru na esiteghm n’aka iwu mara ya: n’ihi na m’gaghi-amatawori agu ihe ọjọ, ma ọ buru na iwu ahu asighi, Agu ihe ọjọ agula gi:

8 ma nmehie, ebe ọ natara ihe ọ gēji megidem, o were ihe enyere n’iwu luta agu ihe ọjọ nile n’otù n’otù nimem: n’ihi na nmehie bu ihe nwuru anwu ma iwu adighi ya.

9 Ma mu onwem nādi ndu otù mb͕e n’oge iwu nādigh: ma mb͕e ihe enyere n’iwu biara, nmehie ahu we di ndu ọzọ, mu onwem we nwua;

10 ihe ahu enyere n’iwu, nke nēdubà na ndu, nka ka m’huru na ọ bu ihe nēdubà n’ọnwu:

11 n’ihi na nmehie, ebe ọ natara ihe ọ gēji megidem, o sitere n’ihe enyere n’iwu ghọb͕uem, site kwa na ya b͕uem.

12 Ya mere iwu ahu di nsọ n’ezie, ihe enyere n’iwu di kwa nsọ, zi kwa ezi, buru kwa ezi ihe.

13 Ya mere, èzi ihe ahu ghọrọ ọnwu n’ebe m’nọ? Chineke ekwela. kama ọ bu nmehie, ka o we puta ìhè na ọ bu nmehie, site n’iwere ezi ihe ahu lutaram ọnwu; ka nmehie we site n’ihe ahu enyere n’iwu ghọ ihe nēmehie nke-uku ri nne.

14 N’ihi na ayi matara na iwu ahu bu ihe nke Mọ: ma mu onwem bu ihe nke anu-aru, erewokwam inọ n’okpuru nmehie.

15 N’ihi na ihe m’nāluta ka m’nāmagh: n’ihi na ihe m’nāchọ, ọ bughi ihe ahu ka m’nēme; kama ihe m’nākpọ asì, ihe ahu ka m’nēme.

16 Ma ọ buru na ihe m’nāchọghi, ihe ahu ka m’nēme, anamekweye iwu ahu na ọ bu ihe ọma.

17 Ma ub͕u a ọ bughi mu onwem nāluta kwa ya ọzọ, kama ọ bu ihe ahu nke nēbi nimem, bú nmehie.

18 N’ihi na amataram na ezi ihe adighi-ebi nimem, nke ahu bu, n’anu-arum: n’ihi na ichọ ihe ọma di nso n’ebe akam gēru, ma iluta ihe ọma adighi nso n’ebe akam gēru.

19 N’ihi na ezi ihe nke m’nāchọ ka m’nēmegh: kama ihe ọjọ nke m’nāchọghi, ihe ahu ka m’nēme.

20 Ma ọ buru na ihe m’nachọghi, ihe ahu ka m’nēme, ọ bughi mu onwem nāluta kwa ya ọzọ, kama ọ bu ihe ahu nke nēbi nimem, bú nmehie.

21 Ya mere ahurum iwu a, na ihe ọjọ dim nso n’ebe akam gēru, mu, bú onye nāchọ ime ihe ọma.

22 N’ihi na mu na iwu Chineke nēnwekọ obi-utọ dika madu imem si di:

23 ma anamahu iwu di iche n’ihe nile dim n’aru, nēbu agha megide iwu nke uchem, nādọtakwam n’agha nye iwu nke nmehie nke di n’ihe nile dim n’aru.

24 Madu nke hujuru anya ka mu onwem bu! ònye gādọputam n’aru nke ọnwu a?

25 Ma ekele diri Chineke na ndọputa sitere n’aka Jisus Kraist Onye-nwe-ayi. Ya mere otú a mu onwem ji uchem buru orù nke iwu Chineke; ma ejim anu-arum buru orù nke iwu nmehie.

Categories
NDI ROM

NDI ROM 8

1 Ya mere ub͕u a ọ dighi amam-ikpe ọ bula diri ndi nọ nime Kraist Jisus.

2 N’ihi na iwu nke Mọ nke ndu nime Kraist Jisus mere ka m’pua n’aka iwu nke nmehie na nke ọnwu, nwere onwem.

3 N’ihi na ihe iwu ahu nāpughi ime, nke ọ nādighi ike nime ya site n’anu-aru, Chineke mere, n’ihi na Ọ mara nmehie ikpé n’anu-aru, mb͕e O zitere Ọkpara nke aka Ya n’oyiyi nke anu-aru nmehie na dika àjà achuru n’ihi nmehie:

4 ka ihe iwu ahu guru n’ihe ziri ezi we mezu nime ayi, bú ndi nādighi-eje dika anu-aru si chọ, kama dika Mọ Nsọ si chọ.

5 N’ihi na ndi di ka anu-aru si chọ nātukwasi uche n’ihe nke anu-aru; ma ndi di ka Mọ Nsọ si chọ nātukwasi uche n’ihe nke Mọ Nsọ.

6 N’ihi na itukwasi uche n’anu-aru bu ọnwu; ma itukwasi uche na Mọ Nsọ bu ndu na udo:

7 n’ihi na itukwasi uche n’anu-aru, ya na Chineke di n’iro; n’ihi na edoghi ya n’okpuru iwu Chineke, n’ihi na apughi kwa ido ya n’okpuru ya:

8 ndi nke nọ n’anu-aru apughi kwa itọ Chineke utọ.

9 Ma unu onwe-unu anọghi n’anu-aru, kama unu nọ nime Mọ Nsọ, ma ọ buru na ọbu ezie na Mọ nke Chineke nēbi nime unu. Ma ọ buru na onye ọ bula enweghi Mọ nke Kraist, onye ahu abughi nke Ya.

10 Ma ọ buru na Kraist nọ nime unu, aru-unu bu ihe nwuru anwu n’ihi nmehie n’ezie; ma Mọ Nsọ bu ndu n’ihi ezi omume.

11 Ma ọ buru na Mọ nke Onye ahu Nke mere ka Jisus si na ndi nwuru anwu bilie nēbi nime unu, Onye ahu Nke mere ka Kraist Jisus si na ndi nwuru anwu bilie gēsite kwa n’aka Mọ-Ya Nke nēbi nime unu me ka aru-unu nke puru inwu anwu di ndu.

12 Ya mere otú a, umu-nnam, ayi bu ndi ji ugwọ̀, ọ bughi anu-aru ka ayi ji, idi ndu dika anu-aru si chọ:

13 n’ihi na asi na unu nādi ndu dika anu-aru si chọ, unu gaje inwu; ma ọ buru na unu nēwere Mọ Nsọ me ka omume aru nwua, unu gādi ndu.

14 N’ihi na ka ha ra, bú ndi Mọ Chineke nēdú, ndi ahu bu umu-ndikom Chineke.

15 N’ihi na unu anataghi mọ nke ibu-orù ilaghachi n’egwù ọzọ; kama unu natara Mọ nke ido-ka-nwa-nwoke, Nke ayi nēti nkpu nime Ya, si, Aba, Nna.

16 Mọ Nsọ onwe-ya soro mọ-ayi nāb͕a àmà, na ayi bu umu Chineke:

17 ma ọ buru na ayi bu umu, ayi bu kwa ndi-nketa; ndi-nketa nke Chineke, na ndi ha na Kraist nēkekọ; ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi na Ya nāhukọ ahuhu, ka ewe nyekọ kwa ayi na Ya otuto.

18 N’ihi na anamagu na ahuhu nile nke oge di ub͕u a ekwesighi ka ekwuta ha ma ele ebube ahu anya, bú nke agaje ikpughe n’ebe ayi nọ.

19 N’ihi na olile-anya siri ike nke ihe nile ekère èkè nēchesi nkpughe nke umu-ndikom Chineke ike.

20 N’ihi na edoro ihe ahu ekèrè èkè n’okpuru ihe-efu, ọ bughi na ọ chọrọ ya, kama n’ihi Onye ahu Nke doro ya n’okpuru ya n’olile-anya;

21 n’ihi na agēme ka ihe ekère èkè onwe-ya pu kwa n’ibu-orù nmebi ba n’ọnọdu inwe-onwe-ya nke ebube nke umu Chineke.

22 N’ihi na ayi matara na ihe ekère èkè nile nāsukọ udè, ime nēmekọ kwa ha, rue ub͕u a.

23 Ma ọ bughi nání nka, kama ayi onwe-ayi, ndi nwere nkpuru mbu nke Mọ Nsọ, ọbuná ayi onwe-ayi nāsu kwa udè nime onwe-ayi, mb͕e ayi nēchesi ido-ka-nwa-nwoke ahu ike, bú nb͕aputa nke aru-ayi.

24 N’ihi na ọ bu n’olile-anya ka azọputara ayi: ma olile-anya nke anāhu anya abughi olile-anya: n’ihi na ihe madu nāhu anya, gini mere o ji nēle anya ya?

25 Ma ọ buru na ayi nēle anya ihe ayi nāhughi anya, ayi ji ntachi-obi nēchesi ya ike.

26 Otù ahu Mọ Nsọ nēye-kwa-ra adighi-ike-ayi aka: n’ihi na ayi amataghi ihe ayi gēkpe n’ekpere dika ayi nāghaghi ikpe; kama ọ bu Mọ Nsọ onwe-ya were isu-udè anāpughi ikwu nāriọrọ ayi aririọ;

27 ma Onye ahu Nke nēnyocha obi-ayi matara ihe Mọ Nsọ nātukwasi uche na ya, n’ihi na Ọ nāriọrọ ndi nsọ aririọ dika Chineke si chọ.

28 Ma ayi matara na ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n’anya ezi ihe, bú ndi akpọrọ dika ihe O nēzube si di.

29 N’ihi na ndi O buru uzọ mara, O bu-kwa-ra uzọ ka ha àkà, ka ha na onyinyo nke Ọkpara-Ya nwekọ otù udi, ka O we buru onye ebu uzọ mu n’etiti ọtutu umu-nna:

30 ma ndi O buru uzọ ka àkà, ndia ka Ọ kpọ-kwa-ra: ma ndi Ọ kpọrọ, ndia ka Ọ gu-kwa-ra na ndi ezi omume: ma ndi Ọ guru na ndi ezi omume, ndia ka O nye-kwa-ra otuto.

31 Gini kwa ka ayi gēkwu n’ile ihe ndia anya? Ọ buru na Chineke diri ayi, ònye nēmegide ayi?

32 Onye ahu Nke nāzọdoghi Ọkpara nke aka Ya, kama Ọ rara Ya nye n’ihi ayi nile, Ò gēsi aṅa ghara inye kwa ayi ihe nile n’amara ebe O weresiri Onye ahu nye ayi?

33 Ònye gēbo ndi Chineke rọputara ebubo? Ọ̀ bu Chineke Onye nāgu ha na ndi ezi omume?

34 Ònye bu onye ahu nke gāma ikpé? Ọ̀ bu Kraist Jisus Onye nwuru, ma nke kariri, emere Ya ka O si na ndi nwuru anwu bilie, Onye nọ n’aka-nri Chineke, Onye nāriọ-kwa-ra ayi aririọ?

35 Ònye gēkewapu ayi n’ihu-n’anya nke Kraist? Ọ̀ bu nkpab͕u, ma-ọbu oké nkpà, ma-ọbu nsob͕u, ma-ọbu oké unwu, ma-ọbu ib͕a-ọtọ, ma-ọbu ize-ndu, ma-ọbu mma-agha?

36 Dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si,

N’ihi Gi ka anēme ka ayi nwua ogologo ubọchi dum;

Aguru ayi dika aturu ob͕ub͕u.

37 É-è, kama n’ihe ndia nile ayi nēmeribiga ókè site n’aka Onye ahu Nke huru ayi n’anya.

38 N’ihi na emewo ka m’kweye, na ọnwu, ma-ọbu ndu, ma-ọbu ndi-mọ-ozi, ma-ọbu ibu-isi di iche iche, ma-ọbu ihe di ub͕u a, ma-ọbu ihe gaje idi, ma-ọbu ike di iche iche,

39 ma-ọbu ihe di elu, ma-ọbu ihe di omimi, ma-ọbu ihe ọ bula ọzọ ekère èkè, agaghi-apu ikewapu ayi n’ihu-n’anya Chineke, nke di nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.

Categories
NDI ROM

NDI ROM 9

1 Anamekwu ezi-okwu nime Kraist, ekwughi m okwu-ugha, akọ-na-uchem nēsokwam b͕a àmà nime Mọ Nsọ,

2 na enwerem oké ihe-nwuta na ihe-nb͕u nādighi-agwu n’obim.

3 N’ihi na anamekperi ekpere, ka mu onwem buru anathema pua n’ebe Kraist nọ n’ihi umu-nnem, ndi-ikwum dika anu-aru si di:

4 ebe ha bu ndi Israel; ndi nwe ido-ka-nwa-nwoke ahu, na ebube ahu, na ọb͕ub͕a-ndu nile, na inye-iwu ahu, na ikpe ekpere ahu n’ulo uku Chineke, na nkwa nile;

5 ndi nwe nna-ayi-hà, ndi Kraist-ayi si kwa n’etiti ha puta dika anu-aru si di, Onye bu Onye-isi ihe nile, bu kwa Chineke, Nke agọziworo rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

6 Ma ọ bughi dika agāsi na okwu Chineke adawo n’ala. N’ihi na ndi si n’Israel puta, ọ bughi ndi ahu nile bu Israel:

7 ọ bughi kwa ha nile bu umu, n’ihi na ha bu nkpuru Abraham: kama, Nime Aisak ka agākpọ nkpuru-gi aha.

8 Nke ahu bu, umu nke anu-aru-ya, ọ bughi ndia bu umu Chineke; kama umu nke nkwa ahu ka anāgu na nkpuru.

9 N’ihi na nka bu okwu nke nkwa, Dika oge a si di M’gābia, Sera gēnwe kwa nwa-nwoke.

10 Ma ọ bughi nání nka; kama Rebeka kwa, mb͕e ọ tusiri ime site n’otù onye, bú Aisak nna-ayi-

11 n’ihi na mb͕e akāmughi umu ahu, mb͕e ha akēmeghi kwa ihe ọ bula, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe nādighi nma, ka ihe Chineke zubere dika nrọputa si di we digide, o siteghi n’ọlu, kama o sitere n’Onye nākpọ,

12 asiri ya, Nke-okenye gēfè nke-ntà.

13 Dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si, Jekob ka M’huru n’anya, ma Isọ ka M’kpọrọ asì.

14 Gini ka ayi gēkwu kwa? Ọ̀ gābu na ajọ omume di n’ebe Chineke nọ? Chineke ekwela.

15 N’ihi na Ọ si Moses, M’gēmere onye ọ bula ebere, bú onye M’nēmere ebere, M’gēnwe kwa obi-ebere n’aru onye ọ bula, bú onye M’gēnwe obi-ebere n’aru-ya.

16 Ya mere otú a ọ bughi nke onye nāchọ, ọ bughi kwa nke onye nāb͕a ọsọ, kama ọ bu nke Onye ahu Nke nēme ebere, bú Chineke.

17 N’ihi na ihe edeworo n’akwukwọ nsọ nāsi Fero, Ọ bu n’ihi otù ihe a ka M’mere ka i bilie, ka M’we gosi ikem nime gi, ka ewe kwusa kwa aham n’uwa nile.

18 Ya mere otú a ọ bu onye Ọ nāchọ ka Ọ nēmere ebere, ọ bu kwa onye Ọ nāchọ ka ọ nēme ka o nwe obi-etili.

19 Ya mere i gāsim, Gini mere Ọ nọ nāta uta? N’ihi na ọ̀ bu onye nēguzogide ihe O zubere?

20 Ajuju kwesikariri iju, gi madu, bu, Gì onwe-gi bu onye, nke nāza Chineke okwu imegide Ya? Ọ̀ gābu na ihe akpuworo gāsi onye kpuru ya, Gini mere i kpurum otú a?

21 Ma-ọbu ọkpu-ite, ò nweghi ike n’ebe urọ di, isite n’otù ọkpukpu-urọ ahu o doziri me nka ka ọ buru ihe gānara nsọpuru, me kwa nke-ọzọ ka ọ buru ihe agēme ihe-ihere?

22 Gini kwa, ma ọ buru na Chineke, ọ bu ezie na Ọ nāchọ igosi iwe-Ya, na ime ka amara ike-Ya, ma O were ogologo-ntachi-obi ri nne nagide ihe iwe edoziworo ka ha bà n’ila-n’iyì:

23 ka O we me kwa ka amara àkù nke ebube-Ya n’aru ihe diri ebere, nke O buru uzọ dozie ka ha ba n’ebube,

24 bú ayi onwe-ayi, ndi Ọ kpọ-kwa-ra, ọ bughi site na nání ndi-Ju, kama site kwa na ndi mba ọzọ?

25 Dika O nēkwu kwa n’akwukwọ Hosea, si,

M’gākpọ ndi ahu ndim, nke nābughi ndim;

M’gākpọ kwa nwanyi ahu onye ahuru n’anya, nke anāhughi n’anya.

26 O gēru kwa, na n’ebe ahu nke asiri ha, Ọ bughi ndim ka unu bu,

N’ebe ahu ka agākpọ ha umu-ndikom nke Chineke di ndu.

27 Ma Aisaia nēti nkpu bayere Israel, si, Ọ buru na ọnu-ọgugu umu Israel di ka ájá nke oké osimiri, ọ bu nke fọduru ka agāzọputa:

28 n’ihí na Onye-nwe-ayi gēme ihe O kwuru n’elu uwa, nēmezu ya nēme kwa ya ka o bìe.

29 Ọzọ, dika Aisaia buru uzọ kwue,

Ọ buru na Onye-nwe usu nile nke ndi-agha arapughi ayi otù nkpuru,

Ayi gādiwori ka Sọdọm, agēmewori ayi ka ayi yie Gọmọra.

30 Gini ka ayi gēkwu kwa? Na ndi mba ọzọ, ọ bu ezie na ha ab͕asoghi ezi omume, ma ha ruru ezi omume, ma ọ bu ezi omume ahu nke si n’okwukwe puta:

31 ma Israel, ọ bu ezie na ha nāb͕aso iwu ezi omume, ma ha ekwudoghi iwu ahu.

32 N’ìhi gini? N’ihi na ha esiteghi n’okwukwe chọ ya, kama dika agāsi na ha sitere n’ọlu chọ ya. Ha suru ngọngọ na nkume nke isu-ngọngọ-ha;

33 dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si,

Le, anamatọb͕ọ nime Zaion nkume nke isu-ngọngọ, na oké nkume nke ima-n’ọnyà:

Onye kwe-kwa-ra na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya n’iru.

Categories
NDI ROM

NDI ROM 10

1 Umu-nnam, ihe di obim ezi nma na aririọ m’nāriọ Chineke n’ihi ha bu, ka azọputa ha.

2 N’ihi na anamab͕ara ha àmà na ha nānu ọku n’obi n’ebe Chineke nọ, ma ọ bughi dika nmazu si di.

3 N’ihi na, ebe ha nāmaghi ezi omume Chineke, nāchọ kwa uzọ ime ka ezi omume nke aka ha guzo, ha edoghi onwe-ha n’okpuru ezi omume Chineke.

4 N’ihi na Kraist bu nsọtu iwu iwetara onye ọ bula nke kwere ezi omume.

5 N’ihi na Moses edewo n’akwukwọ na madu nke nēme ezi omume nke sitere n’iwu gādi ndu nime ya.

6 Ma ezi omume ahu nke sitere n’okwukwe nēkwu otú a, si, Asila n’obi-gi, Ònye gārigo n’elu-igwe? (nke ahu bu, ikudata Kraist:)

7 ma-ọbu, Ònye gārida n’abyss ahu? (nke ahu bu, isi na ndi nwuru anwu kugota Kraist.)

8 Kama ọ̀ bu gini ka ọ nēkwu? Okwu ahu di gi nso, n’ọnu-gi, na n’obi-gi: nke ahu bu, okwu okwukwe, nke ayi nēkwusa:

9 na ọ buru na i gēwere ọnu-gi kwuputa Jisus na Ọ bu Onye-nwe-ayi, ọ buru kwa na i gēwere obi-gi kwere na Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, agāzọputa gí:

10 n’ihi na anēji obi kwere rue ezi omume; anēji kwa ọnu kwuputa rue nzọputa.

11 N’ihi na ihe edeworo n’akwukwọ nsọ nāsi, Onye ọ bula nke kwere na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya.

12 N’ihi na ọ dighi ihe di iche n’etiti onye-Ju na onye-Grik: n’ihi na otù Onye-nwe-ayi ahu bu Onye-nwe ọra madu, buru kwa Onye nwere àkù ri nne inye ndi nile nākpọku Ya:

13 n’ihi na, Onye ọ bula nke gākpọku aha Onye-nwe-ayi, agāzọputa ya.

14 Hà gēsi kwa aṅa kpọku Onye ahu ha akēkweghi na Ya? ma hà gēsi aṅa kwere n’Onye ahu ha akānughi okwu-Ya? ma hà gēsi aṅa nu ma onye nēkwusa anọghi?

15 ma hà gēsi aṅa kwusa, ma ọ buru na ezigaghi ha? dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si, Le, ka ha si ma nma nke-uku, bú ukwu ndi nēzisa ozi ọma nke ezi ihe!

16 Ma ọ bughi ha nile ṅara ozi ọma ahu nti. N’ihi na Aisaia nāsi, Onye-nwe-ayi, ònye kwere ihe ayi nuworo?

17 Ya mere, okwukwe si n’ọnunu puta, ma ọnunu ahu sitere n’okwu Kraist.

18 Ma asim, Ọ̀ gābu na ha anughi? Ha nuru ezie,

N’uwa nile ka olu-ha puru jezue,

Na nsọtu nile nke elu-uwa dum madu bi ka okwu-ha puwo-kwa-ra jezue.

19 Ma asim, Ọ̀ gābu na Israel amaghi? Moses buru uzọ si,

Mu onwem gēwere mba nābughi mba kpasue unu ekworo,

Mba nēnweghi nghọta ka M’gēwere kpasue unu iwe.

20 Ma Aisaia nwere anya-ike nke-uku, we si,

Ndi nāchọghm chọtaram;

Ewerem gosi ndi nājughi ajuju n’akam.

21 Ma Ọ nēkwu okwu bayere Israel, si, Ogologo ubọchi dum ka M’b͕asara akam nye ndi nādighi-ekwenye, ndi nēkwugidekwam.