Categories
NDI KỌLỌSI

NDI KỌLỌSI 1

1 Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n’ọchichọ Chineke, na Timọti nwa-nna-ayi,

2 nēdegara ndi nọ na Kọlọsi akwukwọ, bú umu-nna-ayi nime Kraist ndi di nsọ kwe-kwa-ra ekwe: Amara diri unu na udo nke si n’aka Chineke, bú Nna-ayi, puta.

3 Ayí nēkele Chineke, bú Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nēkpe ekpere bayere unu mb͕e nile,

4 ebe ayi nuru okwu bayere okwukwe nke unu kwere na Kraist Jisus, na ihu-n’anya unu ji hu ndi nsọ nile,

5 n’ihi olile-anya ahu nke edebeworo unu n’elu-igwe, nke unu nuru ihe bayere ya na mbu n’okwu nke ezi-okwu nke ozi ọma,

6 nke biaruru unu; dika ọ nāmiju kwa nkpuru n’uwa nile, nāba kwa uba, dika ọ nēme kwa n’etiti unu, site n’ubọchi unu nuru mazu kwa amara Chineke n’ezi-okwu;

7 dika unu mutara n’ọnu Epafras orù-ibe-ayi onye ayi huru n’anya, onye bu onye kwesiri ntukwasi-obi n’ijere Kraist ozi n’ọnọdu ayi,

8 onye gosi-kwa-ra ayi ihun-anya-unu nime Mọ Nsọ.

9 N’ihi nka ayi onwe-ayi kwa, site n’ubọchi ayi nuru ya, ayi ewepughi aka n’ikpe ekpere na iriọ aririọ n’ihi unu, ka ewe me ka unu juputa na nmazu nke ihe Ọ nāchọ nime amam-ihe na nghọta nile nke Mọ Nsọ,

10 ka unu jegharia n’uzọ kwesiri Onye-nwe-ayi ime otú ọ gātọ Ya utọ n’uzọ nile, nāmi nkpuru n’ezi ọlu nile ọ bula, nāba kwa uba nime nmazu nke Chineke;

11 ebe anēme ka unu di ike nime ike nile, dika ike nke ebube-Ya si di, rue ntachi-obi na ogologo-ntachi-obi nile, ya na ọṅù;

12 nēkele Nna-ayi, Onye mere ka ayi rue iketa òkè-ayi n’ihe-nketa ndi nsọ n’ìhè;

13 Onye dọputara ayi n’ike nke ọchichiri, we webiga ayi n’ala-eze nke Ọkpara nke ihu-n’anya-Ya;

14 Onye ayi nwere nb͕aputa-ayi nime Ya, bú nb͕aghara nmehie nile ayi:

15 Onye bu onyinyo nke Chineke ahu Nke anāpughi ihu anya, buru kwa onye eburu uzọ mu n’ihe nile ekère èkè;

16 n’ihi na nime Ya ka ekère ihe nile, nke di nime elu-igwe na nke di n’elu uwa, ihe apuru ihu anya na ihe anāpughi ihu anya, ma ọ bu oche-eze, ma-ọbu ibu-ndi-nwe-madu, ma-ọbu ibu-ndi-isi, ma-ọbu ichi-isi; esitewo n’aka-Ya kè ihe nile, ekèwo-kwa-ra Ya ihe nile;

17 Ya onwe-ya bū kwa ihe nile uzọ, ọ bu kwa nime Ya ka ihe nile nēguzokọ n’otù.

18 Ya onwe-ya bu kwa isi aru, nke bu nzukọ-Ya: ebe Ọ bu Onye-nmalite, Onye eburu uzọ mu site na ndi nwuru anwu; ka ewe me ka Ya onwe-ya buru onye mbu n’ihe nile.

19 N’ihi na ọ buri ihe di Nna-Ya ezi nma ka ozuzù nile bigide nìme Ya;

20 ka O we site kwa n’aka-Ya me ka Ya onwe-ya na ihe nile di n’otù, ebe O sitesiri n’ọbara nke obe-Ya me ka Ya onwe-ya na madu di n’udo; site n’aka-Ya, ka m’kwuru, ma ọ bu ihe di n’elu uwa, ma-ọbu ihe di n’elu-igwe.

21 Unu onwe-unu kwa, ọ bu ezie na emereri unu ka unu buru ndi ala ọzọ n’oge gara aga, buru kwa ndi-iro n’èchìchè-uche-unu nime ajọ ọlu nile unu, ma ub͕u a ka O mere ka unu na Ya di n’otù

22 nime aru nke anu-aru-Ya, site n’ọnwu-Ya, iche unu n’iru Ya dika ndi di nsọ, ndi anāpughi kwa ita uta, ndi anāpughi kwa ibo ebubo:

23 ma asi na ọ bu ezie na unu anọgide n’okwukwe-unu, ndi atọworo ntọ-ala, ndi nēguzosi kwa ike, ndi anādighi-ewepu kwa n’olile-anya nke ozi ọma ahu nke unu nuru, nke ekwusara n’etiti ihe nile ekère èkè nke di n’okpuru elu-igwe; nke emere mu onwem, bú Pọl, onye nēje ozi ya.

24 Ub͕u a anamaṅuri ọṅu n’ahuhu m’nāhu n’ihi unu, anamemezu kwa n’akuku nkem ihe fọduru na nkpab͕u nile nke Kraist-ayi n’anu-arum n’ihi aru-Ya, nke bu nzukọ-Ya;

25 nke emere mu onwem onye nējere ya ozi, dika ọlu ọchichi-èzí-na-ulo nke Chineke si di nke enyerem n’ebe unu nọ, ikwuzu okwu Chineke,

26 bú ihe-omimi nke ezoworo ezo site n’oge nile site kwa n’ọb͕ọ nile: ma ub͕u a ka emere ya ka ọ puta ìhè nye ndi nsọ Ya,

27 ndi Chineke chọrọ ime ka ha mara ihe bu àkù nke ebube nke ihe-omimi a n’etiti ndi mba ọzọ, nke bu Kraist nime unu, bú olile-anya nke ebube ahu:

28 Onye ayi nēkwusa, nādu madu nile ọ bula ọdú, nēzí kwa madu nile ọ bula n’amam-ihe nile, ka ayi we che madu nile ọ bula n’iru Onye-nwe-ayi dika ndi zuru okè nime Kraist;

29 anamadọb͕u kwa onwem n’ọlu ime ihe a, nāb͕asi nb͕a ike dika i1usi-ọ1u-ike nke Ya si di, nke nālusi ike nimem n’ike.

Categories
NDI KỌLỌSI

NDI KỌLỌSI 2

1 N’ihi na anamachọ ka unu mata otú m’nāb͕asi nb͕a ike nke-uku n’ihi unu na ndi bi na Leọdisia na ka ha ra, bú ndi akāhughi irum n’anu-aru;

2 ka ewe kasie obi-ha, ebe ejikọ-kwa-ra ha n’ihu-n’anya, ka ha we ru kwa àkù nile nke nkwezu ahu nke nghọta nēkwezu, ka ha we mazu ihe-omimi nke Chineke, bú Kraist,

3 Onye àkù nile nke amam-ihe na ihe-ọmuma di nime Ya, bú ihe zoro ezo nime Ya.

4 Nka ka m’nēkwu, ka onye ọ bula we ghara iwere ire-utọ rafue unu.

5 N’ihi na ọ bu ezie na anọghm n’etiti unu n’anu-arum, ma anọm n’etiti unu na mọm, nāṅuri, nēle kwa usoro-unu na otú okwukwe unu kwere na Kraist di ike.

6 Ya mere dika unu nara Kraist-ayi, bú Jisus Onye-nwe-ayi, nējegharinu nime Ya,

7 buru kwa ndi b͕agideworo nkpọrọgwu nime Ya, ndi anēwuli kwa elu dika ulo nime Ya, ndi anēwere kwa okwukwe-unu me ka unu guzosie ike, dika ezíri unu, nēkelebiga ókè.

8 Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iwere ihu-amam-ihe-n’anya na aghughọ efu nke ya buru onye nēzu unu n’ori, ihu-amam-ihe-n’anya nke di ka ihe-ozizí madu nyere idebe, dika ozizí mbu nke uwa, ma ọ dighi ka Kraist si di:

9 n’ihi na nime Ya ka ozuzù nile nke ihe Chineke bu nēbigide nēwere aru madu,

10 nime Ya ka emezuwo-kwa-ra unu emezu, Onye bu isi nke ibu-onye-isi na ichi-isi nile ọ bula:

11 ọ bu kwa nime Ya ka ejiri obibì-úgwù anējighi aka me bì unu úgwù, n’iyipuchasi aru nile nke bu anu-aru, n’obibì-úgwù nke Kraist;

12 ebe elìkọrọ unu na Ya nime baptism-unu, ọ bu kwa nime ya ka esitere n’aka okwukwe-unu me ka unu so Ya bilikọ, bú okwukwe unu kwere n’ilusi-ọ1u-ike nke Chineke, Onye mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie.

13 Unu onwe-unu kwa, mb͕e unu nọ n’ọnwu site na ndahie nile unu na ebìghi-úgwù nke anu-aru-unu, ọbuná unu ka O mere ka unu so Ya dikọ ndu, mb͕e O weresiri amara b͕aghara ayi ndahie-ayi nile;

14 mb͕e O hichapusi-kwa-ra ihe ayi ji aka-ayi de n’akwukwọ ike onwe-ayi ab͕u, nke megidere ayi, bú ihe edere n’iwu nke enyere ayi, nke nēguzogide ayi: O wepuwo kwa ya n’etiti ayi na Ya, nākpọgide ya n’obe-Ya;

15 mb͕e O yipuchasiri n’aru ibu-ndi-isi nile na ichi-isi nile ihe-agha-ha nye Onwe-ya, O were nkwuwa-okwu gosi ha n’iru ọra, nēdughari ha n’ọṅù-agha n’elu obe-Ya.

16 Ya mere, unu ekwela ka onye ọ bula kpo unu n’oriri, ma-ọbu n’ọṅuṅu, ma-ọbu n’okwu ubọchi ememe ma-ọbu nke ọnwa ọhu ma-ọbu nke ubọchi-izu-ike:

17 nke bu onyinyo nke ihe gaje ibia; ma aru bu nke Kraist.

18 Unu ekwela ka onye ọ bula me ihe ọ nāchọ n’ipunara unu ihe unu nāb͕ata n’ọsọ, site n’obi di ume-ala na ikpere ndi-mọ-ozi, nēguzo n’ihe ọ huworo, onye uche nke anu-aru-ya nāfuli elu n’efu,

19 ọ dighi-ejidesi kwa Isi-ayi ike, Onye aru nile, ebe esitere na nkwonkwo-ya na akwara-ya nile nyezu ya ihe jikọ kwa ya n’otù, o sitere na Ya nāba uba nke Chineke.

20 Ọ buru na unu na Kraist nwukọrọ anwu pua n’ihe-ozizí mbu nke uwa, gini mere, dika agāsi na unu nādi ndu n’uwa, unu nēdo onwe-unu n’okpuru iwu di iche iche enyere,

21 Ejidela, edetu-kwa-la ire, emetu-kwa-la aka

22 (bú ihe agēmebi ha nile emebi n’iji ha me ihe), dika ihe enyere n’iwu na ozizí madu si di?

23 Ọ bu ezie na ihe di otú a nwere nke anākpọ amam-ihe n’ikpe ekpere dika madu chọrọ, n’inwe kwa obi di ume-ala, n’ime kwa ka aru hu ahuhu; ma ha abughi ihe di oké ọnu-ahia ma-ọli megide ime ihe ọjọ nke gēju anu-aru afọ.

Categories
NDI KỌLỌSI

NDI KỌLỌSI 3

1 Ya mere, ọ buru na unu soro Kraist-ayi bilikọ, nāchọnu ihe di n’elu, ebe Kraist-ayi nọ, nānọdu n’aka-nri Chineke.

2 Tukwasinu uche n’ihe di n’elu, ọ bughi n’ihe di n’elu uwa.

3 N’ihi na unu nwuru anwu, ezowo kwa ndu-unu n’ebe Kraist-ayi nọ nime Chineke.

4 Mb͕e ọ bula agēme ka Kraist-ayi puta ìhè, Onye bu ndu-ayi, mb͕e ahu ka agēme kwa ka unu onwe-unu so Ya puta ìhè n’ebube.

5 Ya mere, menu ka ihe nile di unu n’aru nke di n’elu uwa nwua; ikwa-iko, adighi-ọcha, ọchichọ ọjọ, agu ihe ọjọ, na anya-uku ahu, n’ihi na nka bu ikpere arusi;

6 ọ bu kwa n’ihi ihe ndia ka iwe Chineke nābiakwasi umu nke ekweyeghi-ekweye;

7 nke unu onwe-unu jeghariri nime ha n’oge gara aga, mb͕e unu nādi ndu nime ihe ndia.

8 Ma ub͕u a unu onwe-unu, tupu-kwa-nu ihe ndia nile; bú iwe, ọnuma, obi ọjọ, nkwulu, ikwu okwu ihere nēsi n’ọnu-unu puta

9 unu ekwula okwu-ugha gwarita ibe-unu; ebe unu yipuchasiworo madu ochie ahu, ya na omume-ya nile,

10 yikwasi kwa madu ọhu ahu, nke anēme ya ka ọ di ọhu rue na nmazu dika onyinyo nke Onye kère ya si di:

11 ebe onye-Grik na onye-Ju, obibì-úgwù na ebìghi-úgwù, onye nāsu asusu ọzọ, onye Sitia, orù, onye nwere onwe-ya, nāpughi idi: ma Kraist bu ihe nile, di kwa nime madu nile.

12 Ya mere dika ndi Chineke rọputara, ndi di nsọ ndi ahuwo-kwa-ra n’anya, yikwasinu obi ebere, obi-ọma, obi di ume-ala, idi-nwayọ, ogologo-ntachi-obi;

13 nānagideritanu ibe-unu, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, asi na onye ọ bula nwere ihe ita onye ọ bula uta; ọbuná dika Onye-nwe-ayi were amara b͕aghara unu, unu onwe-unu me kwa otú a:

14 ma n’elu ihe ndia nile yikwasinu ihu-n’anya, nke bu ihe-nkekọ nke izu-okè.

15 Ka udo nke Kraist nēkpezi kwa okwu n’obi-unu, nke akpọbata-kwa-ra unu nime ya n’otù aru; buru-kwa-nu ndi nēkele ekele.

16 Kwenu ka okwu Kraist were àkù-ya nile biri nime unu n’amam-ihe nile; werenu abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ nēzírita onwe-unu ihe, nādurita kwa onwe-unu ọdu, nime amara enyere unu nābùnu abù nime obi-unu nye Chineke.

17 Ihe nile ọ bula unu nēme kwa, n’okwu ma-ọbu n’ọlu, nēmenu ha nile n’aha Onye-nwe-ayi Jisus, nēkele Chineke, bú Nna-ayi, site n’aka-Ya.

18 Ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n’okpuru di-unu, dika ọ nēkwesi unu nime Onye-nwe-ayi.

19 Ndi bu di, hunu nwunye-unu n’anya, unu enwe-kwa-la obi ilu n’ebe ha nọ.

20 Umu, nāṅanu nti okwu ndi muru unu n’ihe nile, n’ihi na nka bu ihe nātọ ezi utọ nime Onye-nwe-ayi.

21 Ndi bu nna, akpasula umu-unu iwe, ka obi ghara ifù ha.

22 Ndi-orù, nāṅanu nti okwu ndi bu ndi-nwe-unu n’uzọ anu-aru n’ihe nile; ghara iwere ibu-orù-n’anya nāṅa, dika ndi nēme otú ọ gātọ madu utọ, kama n’afọ-ofufo, nātu egwu Onye-nwe-ayi:

23 ihe ọ bula unu nēme, nālunu ọlu site na nkpuru-obi-unu, dika unu nāluru Onye-nwe-ayi ọlu, ọ bughi kwa madu;

24 ebe unu matara na ọ bu n’aka Onye-nwe-ayi ka unu gānata ihe-nnyeghachi-unu, bú ihe-nketa ahu: unu bu orù nke Onye-nwe-ayi Kraist.

25 N’ihi na onye nēme ajọ omume gānaghachi ajọ omume ahu o mere: ile-madu-anya-n’iru adighi kwa.

Categories
NDI KỌLỌSI

NDI KỌLỌSI 4

1 Ndi-nwe madu, nēnye-kwa-nu ndi-orù-unu ihe ziri ezi na nke ra nrata; ebe unu matara na unu onwe-unu nwe-kwa-ra otù Onye Nke bu Onye-nwe-unu n’elu-igwe.

2 Nānọgidesinu ike n’ekpere-unu, nāmu-kwa-nu anya nime ya n’ikele-ekele;

3 nēkpe-kwa-nu ekpere n’ihi ayi n’otù oge ahu, ka Chineke we meghere ayi ọnu-uzọ ikwusa okwu-Ya, ka ayi kwue ihe-omimi nke Kraist, nke m’nọ kwa n’ab͕u n’ihi ya;

4 ka m’we me ka ọ puta ìhè, dika m’nāghaghi ikwu ya.

5 Nējegharinu n’amam-ihe n’ebe ndi nọ n’èzí nọ, nāzuchapuru onwe-unu oge a nile.

6 Ka okwu-unu di n’amara mb͕e nile, ihe eji nnú me ka ọ di utọ, ka unu we mata otú unu nāghaghi iza madu nile ọ bula.

7 Madu nke gēme ka unu mara ihe nile bayere mu onwem bu Tikikọs, onye bu nwa-nna-ayi ahu ahuru n’anya, buru kwa onye kwesiri ntukwasi-obi n’ije-ozi, buru kwa orù-ibem nime Onye-nwe-ayi:

8 onye m’nēzitere unu ime ihe a, ka unu we mara otú ihe nāgara ayi, ka o we kasi kwa obi-unu.

9 Anamezite kwa Ọnisimọs, bú nwa-nna-ayi ahu kwesiri ntukwasi-obi, onye ahu-kwa-ra n’anya, onye bu otù onye n’etiti unu. Ha gēme ka unu mara ihe nile nke anēme n’ebe a.

10 Aristakọs onye adọkọrọ mu na ya n’agha nēkele unu, ya na Mak nwa-nne Banabas (onye unu natara ihe ufọdu enyere n’iwu bayere ya; asi na ọ biakute unu, naranu ya nke-ọma),

11 Jisus kwa, onye anākpọ Justọs, madu atọ ndia sitere n’obibì-úgwù: nání ndia bu ndi sorom nālukọ ọlu n’ikwusa ala-eze Chineke, madu ndi emere ka ha burum ndi-ngugù-obi.

12 Epafras, onye bu otù onye n’etiti unu, orù nke Kraist Jisus, nēkele unu, nāb͕asi nb͕a ike n’ihi unu n’ekpere-ya nile mb͕e nile, ka unu we guzo dika ndi zuru okè ndi kwezuwo-kwa-ra ihe nile Chineke nāchọ.

13 N’ihi na anamab͕ara ya àmà, na ọ nādọb͕u onwe-ya n’ọlu nke-uku nye unu na ndi nọ na Leọdisia na ndi nọ na Hierapọlis.

14 Luk, bú dibia nke ahuru n’anya, nēkele unu, ya na Dimas.

15 Kelenu umu-nna-ayi ndi nọ na Leọdisia, na Nimfas, na nzukọ Kraist nke di n’ulo-ha.

16 Ma mb͕e ọ bula agāgusi akwukwọ-ozi a n’etiti unu, menu ka agu kwa ya na nzukọ Kraist nke ndi Leọdisia; lezi-kwa-nu anya ka unu onwe-unu gu kwa akwukwọ ozi ahu si na Leọdisia bia.

17 Ọzọ, sinu Akipọs, Lezie ije-ozi nke i natara nime Onye-nwe-ayi anya, ka i jezu ya.

18 Ekele nke mu Pọl, nke m’ji aka nkem de. Chetanu ab͕um. Ka amara diyere unu.