Categories
NDI-IKPE

NDI-IKPE 11

1 Ma Jefta, bú onye Gilead, bu dike nke bu dìnkpà, ma ya onwe-ya bu nwa nwayi nākwa iko: ma Gilead muru Jefta.

2 Nwunye Gilead we muara ya umu-ndikom; nwunye-ya we tolite, chupu Jefta, si ya, I gaghi-eketa ihe n’ulo nna-ayi; n’ihi na nwa nwayi ọzọ ka i bu.

3 Jefta we b͕apu n’iru umu-nne-ya, biri n’ala Tob: ndikom efu we chikọta onwe-ha n’ebe Jefta nọ, ha we soro ya pua.

4 O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, na umu Amon busoro Israel agha.

5 O rue, mb͕e umu Amon busoro Israel agha, na ndi-okenye Gilead jere ikuputa Jefta n’ala Tob:

6 ha we si Jefta, Bia, buru ayi onye-ọchi-agha, ka ayi we buso umu Amon agha.

7 Jefta we si ndi-okenye Gilead, Ùnu onwe-unu akpọghm asì, chupukwam n’ulo nnam? ma gini mere unu biakuteworom ub͕u a mb͕e unu nọ na nkpab͕u?

8 Ndi-okenye Gilead we si Jefta, N’ihi nka ka ayi biaghachikuteworo gi ub͕u a, ka i we soro ayi je, buso umu Amon agha, i gāghọ-kwa-ra ayi onye-isi, bú ndi nile bi na Gilead.

9 Jefta we si ndi-okenye Gilead, Ọ buru na unu eme ka m’lata ibuso umu Amon agha, ọ buru kwa na Jehova arara ha nye n’irum, mù onwem gāghọrọ unu onye-isi?

10 Ndi – okenye Gilead we si Jefta, Jehova bu onye nānu okwu a n’etiti ayi, ma ọ buru na ayi emeghi otú a, dika okwu-gi nile si di.

11 Jefta we jeso ndi-okenye Gilead, ndi ahu we mee ya onye-isi na onye-ọchi-agha ichi ha: Jefta we kwue okwu-ya nile n’iru Jehova nime Mizpa.

12 Jefta we ziè ndi-ozi jekuru eze umu Amon, si, Gini ka mu na gi nwekọrọ, na i biakutewom ibuso alam agha?

13 Eze umu Amon we si ndi-ozi Jefta, N’ihi na Israel were alam, mb͕e o si n’Ijipt rigota, site n’Anon we rue Jabok, ru kwa Jọdan: ma ub͕u a nyeghachi ala ahu nile n’udo.

14 Jefta we zì kwa ndi-ozi jekuru eze umu Amon ọzọ:

15 ọ si ya, Otú a ka Jefta siri, Israel eweghi ala Moab ma-ọbu ala umu Amon:

16 n’ihi na mb͕e ha siri n’Ijipt rigota, Israel we je ije n’ọzara rue Oké Osimiri Uhie, biarue Kedesh;

17 Israel we zìe ndi-ozi jekuru eze Edom, si, Biko, ka m’gabiga nime ala-gi: ma eze Edom egeghi nti. Ọzọ kwa, o ziri ndi-ozi jekuru eze Moab: ma ọ kwegh: Israel we nọdu na Kedesh.

18 O we je ije n’ọzara, ga ala Edom na ala Moab buruburu, biarue akuku ọwuwa-anyanwu ala Moab, ha we ma ulo-ikwū-ha n’ofè Anon; ma ha abaghi n’ókè-ala Moab, n’ihi na Anon bu ókè-ala Moab.

19 Israel we zìe ndi-ozi jekuru Saihon, bú eze ndi-Amorait, bú eze Heshbon; Israel we si ya, Biko, ka ayi gabiga nime ala-gi rue ebe nkem.

20 Ma Saihon atukwasighi Israel obi igabiga nime ókè-ala-ya: ma Saihon chikọtara ndi-ya nile, ha we ma ulo-ikwū-ha na Jehaz, o buso Israel agha.

21 Jehova, bú Chineke Israel, we nye Saihon na ndi-ya nile n’aka Israel, ha we tib͕ue ha: Israel we nweta ala nile nke ndi-Amorait, bú ndi bi n’ala ahu.

22 Ha we nweta ókè-ala nile nke ndi-Amorait, site n’Anon we rue Jabok, site kwa n’ọzara we rue Jọdan.

23 Ma ub͕u a Jehova, bú Chineke Israel, anapuwo ndi-Amorait ala-ha n’iru ndi-Ya, bú Israel, ọ̀ bu kwa gi onwe-gi gēnweta ha?

24 Ọ̀ bughi ihe Kemosh, bú chi-gi, nēme gi ka i nweta, ka i gēnweta? Ma onye ọ bula Jehova, bú Chineke – ayi, napuworo ala-ya n’iru ayi, nke ahu ka ayi gēnweta.

25 Ma ub͕u a, gi onwe-gi, ì di nma ma-ọli kari Belak nwa Zipoa, bú eze Moab? ọ̀ chọrọ Israel okwu ma-ọli? ma-ọbu ò busoro ha agha ma-ọli?

26 Mb͕e Israel biri na Heshbon na n’umu-obodo-ya, na n’Aroea na n’umu-obodo-ya, na n’obodo nile nke di n’akuku Anon, ọgu arọ iri-na-ise; gini mere unu anaputaghi kwa ha n’aka-ha na mb͕e ahu?

27 Mu onwem emehieghi kwa megide gi, ma gi onwe-gi nēmem ihe ọjọ n’ibusom agha: Jehova, bú Onye-ikpe, gēkpe ikpe ta n’etiti umu Israel na umu Amon.

28 Ma eze umu Amon egeghi nti okwu nile nke Jefta nke o zitere ya.

29 Mọ nke Jehova we dikwasi Jefta, o we gabiga Gilead na Manase, gabiga kwa Mizpa Gilead, si na Mizpa nke Gilead gabiga rue umu Amon.

30 Jefta we kwe Jehova nkwa, si, Ọ buru na I nye umu Amon n’akam n’ezie,

31 o gēru kwa, na ihe ọ bula nke gēsi n’ọnu-uzọ ulom puta izutem, mb͕e m’siri n’umu Amon lata n’udo, Jehova gēnwe ya, m’gēsure kwa ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku.

32 Jefta we gabiga rue umu Amon ibuso ha agha; Jehova we nye ha n’aka-ya.

33 Ọ we tib͕ue ha oké ntib͕u uku site n’Aroea we rue ebe i si ba Minit, bú orú obodo, ru kwa Ebel-Keramim. Ewe me ka umu Amon ruru ala n’iru umu Israel.

34 Jefta we bia Mizpa rue ulo-ya, ma, le, nwa-ya nwayi chiri egwú-otiti na ite-egwú nāputa izute ya: ma nání nwata ahu bu otù nwa o nwere; ọ dighi nwa-nwoke ma-ọbu nwa-nwayi o nwere ma-ọbughi nání ya.

35 O rue, mb͕e ọ huru ya, na ọ dọwara uwe-ya nile, si, Ewó, adam! i mewo ka m’ruru ala nke-uku, gi onwe-gi adiwo kwa n’etiti ndi nēmekpam aru: ma mu onwem, asaghepuworom Jehova ọnum, apughkwam ilaghachi azu.

36 Ọ si ya, Nnam, i saghepuworo Jehova ọnu-gi; mem dika ihe ahu si di nke siworo n’ọnu-gi puta; ebe Jehova bọworo gi ọ́bọ̀ n’aru ndi-iro-gi, bú n’aru umu Amon.

37 O we si nna-ya, Ka emem ihe a: ram aka ọnwa abua, ka m’we je rida rue n’elu ugwu, kwa ákwá bayere ọnọdu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke m’nọ, mu onwem na umu-ab͕ọghọ-ibem.

38 Ọ si, Je. O we zipu ya ọnwa abua: o we je, ya onwe-ya na umu-ab͕ọghọ-ibe-ya, kwa ákwá bayere ọnọdu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke ọ nọ n’elu ugwu.

39 O rue, n’ọgwugwu ọnwa abua, na ọ laghachikuru nna-ya, o me ya nkwa-ya nke o kwere: nwata ahu amaghi kwa nwoke. O we buru ukpuru n’Israel,

40 na umu-ndinyom Israel nēje kwa-arọ ikọ akukọ nwa-nwayi Jefta onye Gilead ubọchi anọ n’arọ.

Categories
NDI-IKPE

NDI-IKPE 12

1 Ndikom Efraim we kpọkọta onwe-ha, gabiga akuku Ugwu; ha we si Jefta, Gini mere i gabigara ibuso umu Amon agha, ma ayi ka i nākpọghi isoro gi je? ayi gēsure ulo-gi n’isi gi n’ọku.

2 Jefta we si ha, Onye nēse okwu nke-uku ka m’buworo, mu onwem na ndim na umu Amon; m’we tikue unu, ma unu azọputaghm n’aka-ha.

3 M’we hu na unu abughi ndi nāzọputam, m’we tiye ndum n’ọbu-akam, gabiga imegide umu Amon, Jehova we nye ha n’akam: n’ìhi gini kwa ka unu rigokuteworom ta ibusom agha?

4 Jefta we chikọta ndikom nile nke Gilead, buso Efraim agha: ndikom Gilead we tib͕ue Efraim, n’ihi na ha siri, Ndi b͕apuru ab͕apu nke Efraim ka unu, bú ndi Gilead, bu, n’etiti Efraim, na n’etiti Manase.

5 Gilead we were ngabiga-miri Jọdan nile n’uzo ije Efraim: o rue, mb͕e ndi b͕apuru ab͕apu nke Efraim siri, Ka m’gabiga, na ndikom Gilead siri ya, Ọ̀ bu onye Efraim ka i bu? Ọ si, É-è;

6 ha si ya, Biko, si Shibolet; ọ si, Sibolet; n’ihi na o dozighi onwe-ya ikpọ ya nke-ọma; ha we jide ya, b͕ue ya na ngabiga-miri Jọdan: orú nnù ndikom uzọ ise na nnù ise we da mb͕e ahu site n’Efraim.

7 Jefta we kpe Israel ikpe arọ isi. Jefta, bú onye Gilead, we nwua, elìe ya n’obodo Gilead.

8 Mb͕e ọ nwusiri, Ibzan, onye sitere na Bet-lehem, we kpe Israel ikpe.

9 O nwe-kwa-ra orú umu-ndikom na iri ọ muru, ọ bu kwa orú umu-ya ndinyom na iri ka o zipuru n’èzí, orú ndinyom na iri ka o me-kwa-ra ka ha si n’èzí batara umu-ya ndikom. O we kpe Israel ikpe arọ asa.

10 Ibzan we nwua, elìe ya na Bet-lehem.

11 Mb͕e ọ nwusiri, Ilon, bú onye Zebulun, we kpe Israel ikpe; o we kpe Israel arọ iri.

12 Ilon, bú onye Zebulun, we nwua, elìe ya n’Ajalon n’ala Zebulun.

13 Mb͕e ọ nwusiri, Abdon nwa Hilel, bú onye Piraton, we kpe Israel ikpe.

14 O nwe-kwa-ra ọgu umu-ndikom abua na orú umu umu na iri, ndi ọgu umu-inyinya-ibu atọ na iri nēbu: o we kpe Israel ikpe arọ asatọ.

15 Abdon nwa Hilel, bú onye Piraton, we nwua, elìe ya na Piraton n’ala Efraim, n’ugwu ndi Amalek.

Categories
NDI-IKPE

NDI-IKPE 13

1 Umu Israel we me kwa ihe ọjọ n’anya Jehova ọzọ; Jehova we nye ha n’aka ndi Filistia ọgu arọ abua.

2 Ma otù nwoke nke Zọra di, sitere n’ab͕uru ndi Dan, aha-ya bu Manoa; ma nwunye-ya bu nwanyi-àgà, ọ mughi kwa nwa.

3 Mọ ozi nke Jehova we me ka nwayi ahu hu ya anya, si ya, Biko, le, gi onwe-gi bu nwayi-àgà, i mughi kwa nwa: ma i gāturu ime, mua nwa-nwoke.

4 Ma ub͕u a, biko, lezie anya, aṅu-kwa-la manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nābà n’anya, eri-kwa-la ihe ọ bula ruru árú:

5 n’ihi na, le, i gaje itu ime, mua nwa-nwoke: aguba agaghi-aga n’elu isi-ya: n’ihi na onye-Nazirait nke Chineke ka nwata ahu gābu site n’afọ: ya onwe-ya gāmalite kwa izọputa Israel n’aka ndi Filistia.

6 Nwayi ahu we bia, gwa di-ya, si, Onye nke Chineke biakuterem, n’ile ya anya ọ di kwa ka mọ-ozi nke Chineke n’ile ya anya, ọ di itu egwu nke-uku; ma ajughm ya ebe o si bia, o gosighkwam aha-ya:

7 o we sim, Le, i gaje itu ime, mua nwa-nwoke; ma ub͕u a aṅula manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nābà n’anya, eri-kwa-la ihe ọ bula ruru árú: n’ihi na onye-Nazirait nke Chineke ka nwata ahu gābu site n’afọ rue ubọchi ọnwu-ya.

8 Manoa we riọ Jehova aririọ, si, Biko, Onye-nwe-ayi, ka onye nke Chineke ahu nke I zitere biaghachikute ayi ọzọ, ariọm I, ka o zí kwa ayi ihe ayi gēme nwata ahu nke agāmu.

9 Chineke we ge nti olu Manoa; mọ-ozi nke Chineke we biakute nwayi ahu ọzọ ka ya onwe-ya nānọdu n’ubi: ma Manoa, bú di-ya, anọyeghi ya.

10 Nwayi ahu we me ngwa, b͕a ọsọ, gosi di-ya, si ya, Le, nwoke ahu nke biakuterem ubọchi a emewo ka m’hu ya anya ọzọ.

11 Manoa we bilie, jeso nwunye-ya, biakute nwoke ahu, si ya, Gi onwe-gi, ì bu nwoke ahu nke gwara nwayi a okwu? O we si, Mu ka ọ bu.

12 Manoa we si, Ub͕u a ka okwu-gi nile rè: gini gābu ikpé bayere nwata ahu, gini gābu kwa omume-ya?

13 Mọ-ozi nke Jehova we si Manoa, N’ihe nile nke m’siri nwayi a ya lezie anya.

14 Ọ gaghi-eri ihe sitere n’ihe ọ bula nke nēsi n’osisi vine nke manya-vine puta, ya aṅu-kwa-la manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n’anya, ya eri-kwa-la ihe ọ bula ruru árú; ihe nile nke m’nyere ya n’iwu ka ọ gēdebe.

15 Manoa we si mọ-ozi nke Jehova, Biko, kwe ka ayi b͕ochie gi, ka ayi we dozie nwa-ewu n’iru gi.

16 Mọ-ozi nke Jehova we si Manoa, Ọ buru na i b͕ochiem, m’gaghi-eri nime nri-gi: ọ buru kwa na i me àjà-nsure-ọku, ọ bu Jehova ka i gēsurere ya. N’ihi na Manoa amaghi na mọ-ozi nke Jehova ka ọ bu.

17 Manoa we si mọ-ozi nke Jehova, Gini bu aha-gi, ka ayi we sọpuru gi mb͕e okwu-gi nile gēre?

18 Mọ-ozi nke Jehova we si ya, N’ìhi gini kwa ka i nāju ajuju bayere aham, ebe aha ahu di ebube?

19 Manoa we were nwa-ewu ahu na onyinye-inata-iru-ọma, surere ya Jehova ọku n’elu oké nkume: mọ-ozi nālu kwa oké ọlu, ma Manoa na nwunye-ya nēle ya anya.

20 O rue, mb͕e ire-ọku nēsi n’ebe-ichu-àjà ahu rigo n’elu-igwe, na mọ-ozi nke Jehova rigoro nime ire-ọku nke ebe-ichu-àjà ahu: Manoa na nwunye-ya nēle kwa ya anya; ha we da kpue iru-ha n’ala.

21 Ma mọ-ozi ahu emeghi ka Manoa na nwunye-ya hu kwa ya anya ọzọ. Mb͕e ahu Manoa mara na mọ-ozi nke Jehova ka ọ bu.

22 Manoa we si nwunye-ya, Ayi aghaghi inwu, n’ihi na ọ bu Chineke ka ayi huworo.

23 Nwunye-ya we si ya, Ọ buru na ọ tọrọ Jehova uto ime ka ayi nwua, Ọ gaghi-anarawori àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma n’aka-ayi, Ọ gaghi-eme kwa ka ayi hu ihe ndia nile, Ọ gaghi-eme kwa ayi nu ihe di otú a dika na mb͕e a.

24 Nwanyi ahu we mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Samson: nwata ahu we tó etó, Jehova we gọzie ya.

25 Mọ nke Jehova we malite ikwali obi-ya na Mahane-dan, n’etiti Zọra na Eshtaol.

Categories
NDI-IKPE

NDI-IKPE 14

1 Samson we ridarue Timna, hu otù nwayi nime Timna sitere n’umu-ndinyom ndi Filistia.

2 O we rigota, gosi nna-ya, gosi kwa nne-ya, si, Ahuwom otù nwayi nime Timna sitere n’umu-ndinyom ndi Filistia: ma ub͕u a, lutaram ya na nwunye.

3 Nna-ya na nne-ya we si ya, Ọ̀ dighi nwayi di n’etiti umu-ndinyom umu-nne-gi, ma-ọbu n’etiti ndim nile, na gi onwe-gi nēje iluru nwunye sitere na ndi Filistia, bú ndi anēbìghi úgwù? Samson we si nna-ya, Lutaram ya; n’ihi na ya onwe-ya ziri ezi n’anyam.

4 Ma nna-ya na nne-ya amaghi na ọ bu Jehova ka o sitere n’aka; n’ihi na uzọ Ọ gēsi megide ndi Filistia ka ya onwe-ya nāchọ. Ma na mb͕e ahu ndi Filistia nāchi Israel.

5 Samson we rida, ya na nna-ya na nne-ya, rue Timna, ha we biarue ubi-vine Timna: ma, le, nwa-ọdum tozuru etozu nāb͕ọ uja izute ya.

6 Mọ nke Jehova we dakwasi ya n’ike, o we dọwa ya dika ọ gādọwa nwa-ewu, ma ọ dighi ihe o ji n’aka-ya: ma o gosighi nna-ya, o gosighi kwa nne-ya, ihe o mere.

7 Ọ we rida, gwa nwanyi ahu okwu; o ziri ezi n’anya Samson.

8 Mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, o we jeghachi ikuru ya, o we wezuga onwe-ya ihu ozu ọdum ahu: ma, le, ìgwè aṅu di n’ozu ọdum ahu, na manu-aṅu.

9 O we rara manu-aṅu ahu n’ọbu-aka-ya abua, we nēje, nāracha ya ka ọ nēje, o we jekuru nna-ya, jekuru kwa nne-ya, nye ha, ha we racha: ma o gosighi ha na ọ bu n’ozu ọdum ka o siri rara manu-aṅu ahu.

10 Nna-ya we ridakuru nwayi ahu: Samson we me oké oriri n’ebe ahu; n’ihi na otú a ka umu-okorọbia nēme.

11 O rue, mb͕e ha huru ya, na ha chitara orú eyì na iri ka ha nọyere ya.

12 Samson we si ha, Biko, ka m’luere unu ilu: ọ buru na unu egosim ya nke-ọma n’ubọchi asa nke oké oriri a, ọ buru na unu achọta ya, m’gēnye kwa unu orú uwe ákwà ọcha na iri na orú uwe nb͕anwe na iri:

13 ma ọ buru na unu apughi igosim ya, unu onwe-unu gēnyekwan orú uwe ákwà ọcha na iri na orú uwe nb͕anwe na iri. Ha we si ya, Lue ilu-gi, ka ayi we nu ya.

14 O we si ha,

N’aru onye nēri eri ka ihe-oriri si puta,

N’aru ihe di ike ka ihe-utọ si puta kwa.

Ma ha apughi igosi ilu ahu n’ubọchi atọ.

15 O rue, n’ubọchi nke-asa, na ha siri nwunye Samson, Rà di-gi ọnu, ka o we gosi ayi ilu ahu, ka ayi we ghara isure gi na ulo nna-gi n’ọku: ọ̀ bu inapu ayi ihe nile ayi nwere ka unu kpọrọ ayi? ọ̀ bughi otú a?

16 Nwunye Samson we kwakwasi ya ákwá, si, Nání asì ka i nākpọm, i hughkwam n’anya: i luworo umu ndim ilu, ma mu ka i nēgosighi ya. Ọ si ya, Le, nnam na nnem ka m’nēgosighi ya, ọ̀ bu kwa gi ka m’gēgosi ya?

17 O we nākwasi ya ákwá n’ubọchi asa ahu, nke oké oriri-ha diruru: o rue, n’ubọchi nke-asa, na o gosiri ya, n’ihi na ọ kpagidesiri ya ike: o we gosi umu ndi-ya ilu ahu.

18 Ndikom obdo ahu we si ya n’ubọchi nke-asa tutu anyanwu ada, Gini di utọ kari manu-aṅu? ma-ọbu gini di ike kari ọdum? O we si ha,

Ọ buru na unu ejighi nwa-ab͕ọghọ-ehim dọ ihe eji gwu ala-ubi,

Unu agaghi-achọtawori ilum.

19 Mọ nke Jehova we dakwasi ya n’ike, o we ridarue Ashkelon, tib͕ue orú ndikom na iri n’etiti ha, chiri ihe-ha ọ lutara, nye ndi gosiworo ilu ahu uwe nb͕anwe. Iwe-ya we di ọku, o we rigorue ulo nna-ya.

20 Nwunye Samson we ghọrọ nwoke-ibe Samson nwunye, bú nwoke nke Samson buru ya eyì.

Categories
NDI-IKPE

NDI-IKPE 15

1 O rue, mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, na mb͕e obìbì ọka wheat, na Samson were nwa-ewu leta nwunye-ya; ọ si, Ka m’bakuru nwunyem n’ime-ulo. Ma nna nwunye-ya ekweghi ka ọ ba.

2 Nna-ya we si, Asirim n’ezie na i kpọrọ ya asì nke-uku; m’we nye ya nwoke-ibe-gi: nwa-nne-ya nke-ntà, ọ̀ dighi nma kari ya? biko, ka ọ nọchiri gi n’ọnọdu ya.

3 Samson we si ha, Otù ub͕ò a m’gābu onye ikpe nāmaghi kari ndi Filistia, ọ bu ezie na mu onwem nēme ha ihe ọjọ.

4 Samson we je nwude ọgu nkita-ọhia iri-na-ise, chiri ọwa, che ọdudù iru, tiye otù ọwa n’etiti ọdudù abua n’ab͕ata ha.

5 Ọ we muye ọku n’ọwa nile, zipu ha ga n’ọka guzoro eguzo nke ndi Filistia, we sure ma obo ọka ma ọka guzoro eguzo, ha na ubi-olive.

6 Ndi Filistia we si, Ònye meworo nka? Ha si, Samson, di nwa onye Timna, n’ihi na ọ narawo ya nwunye-ya, nye ya nwoke-ibe-ya. Ndi Filistia we rigo, kpọre ya na nna-ya n’ọku.

7 Samson we si ha, Ọ buru na unu eme otú a, aghaghm ibọrọ onwem ọ́bọ n’aru unu, ma emesia m’gāgha.

8 O we tib͕ue ha ntib͕u uku, ogwe-ukwu n’elu apata-ukwu: ọ we rida, nọdu nime nb͕awa nke nkume di elu, bú Itam.

9 Ndi Filistia we rigo, ma ulo-ikwū-ha nime Juda, b͕asa onwe-ha nime Lehi.

10 Ndikom Juda we si, N’ìhi gini ka unu rigotaworo megide ayi? Ha si, Ike Samson ab͕u ka ayi rigotaworo, ime ya dika o meworo ayi.

11 Nnù ndikom Juda asa na ọgu iri we ridarue nb͕awa nkume di elu, bú Itam, si Samson, Ì maghi na ndi Filistia bu ndi nāchi ayi? gini bu kwa nka i meworo ayi? Ọ si ha, Dika ha merem, otú a ka m’meworo ha.

12 Ha si ya, Ike gi ab͕u ka ayi ridataworo, inye gi n’aka ndi Filistia. Samson we si ha, Ṅuaranum iyi, ka unu we ghara idakwasim, unu onwe-unu.

13 Ha we gwa ya okwu, si, É-è; kama ayi gēkesi gi ab͕u ike, nye gi n’aka-ha: ma ayi agaghi-eme ka i nwua ma-ọli. Ha we chiri udọ̀ ọhu abua ke ya ab͕u, me ka o si na nkume ahu di elu rigota.

14 Mb͕e ya onwe-ya biaruru Lehi, ndi Filistia we tie nkpu n’izute ya: Mọ nke Jehova we dakwasi ya n’ike, udọ̀ abua nke di n’ogwe-aka-ya abua we di ka flax nke reworo n’ọku, ab͕u-ya nile we b͕azepu n’aka-ya abua.

15 O we huta ọkpukpu-àb͕à ọhu nke inyinya-ibu, setipu aka-ya, jide ya, were ya tib͕ue nnù ndikom abua na ọgu iri.

16 Samson we si,

Ọkpukpu – àb͕à inyinya – ibu ka m’jiworo, otù obo, obo abua,

Ọkpukpu – àb͕à inyinya – ibu ka m’jiworo tib͕u nnù ndikom abua na ọgu iri.

17 O rue, mb͕e o kwubìri okwu, na ọ tupuru ọkpukpu-àb͕à-anu ahu n’aka-ya; o we kpọ ebe ahu Remat-lehi.

18 Akpiri we kpọ ya nku nke-uku, o we kpọkue Jehova, si, Gi onwe-gi esiwo n’aka orù-gi nye nzọputa uku a: ma ub͕u a m’gānwu n’akpiri-ikpọ-nku, dabà n’aka nke ndia anēbìghi úgwù.

19 Chineke we b͕awa olùlù ahu nke di nime Lehi, miri we si nime ya puta; o we ṅua, mọ-ya we biaghachi, o we di ndu; n’ihi ya ọ kpọrọ aha-ya En-hakore, nke di na Lehi, rue ta.

20 Ọ we kpe Israel ikpe na mb͕e ndi Filistia orú arọ.

Categories
NDI-IKPE

NDI-IKPE 16

1 Samson we jerue Geza, hu otù nwayi nākwa iko n’ebe ahu, o we bakuru ya.

2 Ewe gwa ndi Geza, si, Samson abiawo ebe a. Ha we b͕a ya buruburu, che ya anwu abali ahu nile n’ọnu-uzọ-ama obodo, nọdu du abali ahu nile, si, Ka ọ di rue ìhè ututu, ayi we b͕ue ya.

3 Samson we dina rue etiti abali, bilie n’etiti abali, jide ibo ọnu-uzọ-ama obodo, jide kwa ide-ya abua, ropu ha, tiyere nkpọrọ, tukwasi ha n’ubu-ya abua, būru ha rigo n’elu ugwu nke di n’iru Hebron.

4 O rue, mb͕e nka gasiri, na ọ huru otù nwayi n’anya na ndagwurugwu Sorek, onye aha-ya bu Delaila.

5 Ndi-isi ndi Filistia we rigokuru ya, si ya, Rà ya ọnu, hu ihe ọ bu, bú nke ike uku ya di nime ya, na ihe ayi gēji pu imegide ya, ka ayi we ke ya ab͕u iweda ya n’ala: ayi onwe-ayi gēnye kwa gi, nwoke ọ bula nime ayi, nnù ọla-ọcha abua na ọgu iri-na-ise.

6 Delaila we si Samson, Biko, gosim ihe ọ bu, bú nke ike uku gi di nime ya, na ihe agēji ke gi ab͕u iweda gi n’ala.

7 Samson we si ya, Ọ buru na ha ewere akwara ọhu asa nke anāmikọghi amikọ kem ab͕u, m’gābu kwa onye nādighi ike, di kwa ka madu ọ bula si di.

8 Ndi-isi Filistia we chigoro Delaila akwara ọhu asa nke anāmikọghi amikọ, o we were ha ke ya ab͕u.

9 Ma o nwere ndi nēche anwu nānọdu n’ime-ulo. O we si ya, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. O we dọbìe akwara asa ahu, dika anādọbì eriri-nzuzu mb͕e aṅara ya ọku. Amaghi kwa ike-ya.

10 Delaila we si Samson, Le, i kwawom emò, gwam okwu-ugha: biko, gosim ub͕u a ihe agēji ke gi ab͕u.

11 Ọ si ya, Ọ buru na ha achiri udọ̀ ọhu, nke akējighi je ozi ọ bula, kesim ab͕u ike, m’gābu kwa onye nādighi ike, di kwa ka madu ọ bula si di.

12 Delaila we chiri udọ̀ ọhu, were ha ke ya ab͕u, si ya, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. Ma ndi nēche anwu nānọdu n’ime-ulo. O we dọbìpu ha n’ogwe – aka – ya abua dika ogho.

13 Delaila we si Samson, Rue ub͕u a i kwawom emò, gwam okwu-ugha: gosim ihe agēji ke gi ab͕u. Ọ si ya, Ọ buru na i kpà osusu asa nke isim n’ákwà akpara.

14 O we were ǹtú ya, si ya, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. O we teta n’ura-ya, were ǹtú nke ihe eji akpà ákwà na ákwà ahu akpara, bulie ije-ya.

15 Delaila we si ya, Ì si aṅa si, Ahurum i n’anya, ma obi-gi adighi n’ebe m’nọ? ub͕ò atọ a ka i kwaworom emò, ma i gosighm ihe ọ bu, bú nke ike uku gi di nime ya.

16 O rue, mb͕e o were okwu-ya nile kpagide ya ubọchi nile, sob͕u kwa ya, na nkpuru-obi-ya enweghi ntachi-obi rue ọnwu.

17 O we gosi ya obi-ya nile, si ya, Ọ dighi mb͕e aguba gara n’elu isim; n’ihi na onye-Nazirait nke Chineke ka m’bu site n’afọ nnem: ọ buru na akọpum isi, ikem gēsi n’arum wezuga onwe-ya, m’gābu kwa onye nādighi ike, di kwa ka madu nile si di.

18 Delaila we hu na o gosiri ya obi-ya nile, o we ziga kpọ ndi-isi ndi Filistia, si, Rigotanu otù ub͕ò a, n’ihi na o gosiwom obi-ya nile. Ndi-isi ndi Filistia we rigokute ya, chigota ego ahu n’aka-ha.

19 O we me ka Samson raru ura n’ikperè-ukwu-ya abua; o we malite iweda ya n’ala, ike-ya we si n’aru ya wezuga onwe-ya.

20 O we si, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. O we teta n’ura-ya, si, M’gāpu dika m’nēme ub͕ò ub͕ò, we meghari aru. Ma ya onwe-ya amaghi na Jehova esiwo n’ebe ọ nọ wezuga Onwe-ya.

21 Ndi Filistia we jide ya, rukpọ anya-ya abua; ha we me ka ọ ridarue Geza, were ihe ọla abua ke ya ab͕u; o we buru onye nēgwe ọka n’ulo ndi ekere ab͕u.

22 Agiri-isi-ya we malite irute mb͕e akọpusiri ya.

23 Ndi-isi ndi Filistia we chikọta onwe-ha ichuru Degon, bú chi-ha, àjà uku, na iṅuri ọṅu: ha si, Chi-ayi enyewo Samson, bú onye-iro-ayi, n’aka-ayi.

24 Ndi ahu we hu ya, to chi-ha: n’ihi na ha siri, Chi-ayi enyewo onye-iro-ayi n’aka-ayi, bú onye nēme ka ala-ayi tọb͕ọrọ n’efu, onye me-kwa-ra ka ndi-ayi eb͕uru eb͕u ba uba.

25 O rue, mb͕e obi-ha di nma, na ha siri, Kpọnu Samson, ka ọ we mere ayi ihe-ọchì. Ha we si n’ulo ndi ekere ab͕u kpọputa Samson; o we me ihe-ọchì n’iru ha: ha we me ka o guzo n’etiti ogidi.

26 Samson we si nwa-okoro onye nēji ya n’aka, Ka m’nọduru onwem, ka m’we metu ogidi nke ulo nēguzosi ike n’elu ha aka, ka m’we dabere ha.

27 Ma ulo ahu juputara na ndikom na ndinyom; n’ebe ahu ka ndi-isi nile nke ndi Filistia nọ kwa; ihe ra ka nnù ndikom na ndinyom asa na ọgu iri nọ kwa n’elu ulo, ndi nēle ka Samson nēme ihe-ọchì.

28 Samson we kpọkue Jehova, si, Onye-nwe-ayi Jehova, biko, chetam, biko, Chineke, mekwam ka m’di ike nání otù ub͕ò a, ka m’bọ-kwa-ra onwem ọ́bọ̀ otù mb͕e n’aru ndi Filistia n’ihi anyam abua.

29 Samson we b͕akua ogidi abua nke di n’etiti, nke ulo nēguzosi ike n’elu ha, o we dabere ha, otù n’aka-nri-ya, na otù n’aka-ekpe-ya.

30 Samson we si, Ka mu onwem soro ndi Filistia nwua. O we were ike rulata onwe-ya; ulo ahu we dakwasi ndi-isi ahu, dakwasi kwa ndi nile nọ nime ya. Ndi nwuru anwu ndi o mere ka ha nwua n’ọnwu-ya we di ọtutu kari ndi o mere ka ha nwua na ndu-ya.

31 Umu-nne-ya na ulo nna-ya nile we rida, bulie ya, bugota ya, lìe ya n’etiti Zọra na Eshtaol n’ílì Manoa, bú nna-ya. O we kpe Israel ikpe orú arọ.

Categories
NDI-IKPE

NDI-IKPE 17

1 Ma otù nwoke nke ugwu Efraim di, aha-ya bu Maika.

2 Ọ si nne-ya, Nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri-na-ise ahu i nwere nke ewere ewere, nke gi onwe-gi b͕ara iyi bayere ya, i we kwu kwa ya na ntim, le, ọla-ọcha ahu di n’akam; mu onwem were ya. Nne-ya we si, Onye agọziri agọzi diri Jehova ka nwam bu.

3 Ọ we nyeghachi nne-ya nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri-na-ise ahu, nne-ya we si, Edoworom Jehova ọla-ọcha ahu nsọ n’ezie site n’akam inye nwam, ime arusi apiri api na arusi awuru awu: ma ub͕u a m’gēnyeghachi gi ya.

4 Ọ we nyeghachi nne-ya ọla-ọcha ahu, nne-ya we chiri ọgu ego ọla-ọcha iri, nye onye-nnucha-ọla, o we me ya arusi apiri api na arusi awuru awu: o we di n’ulo Maika.

5 Nwoke ahu, bú Maika, we nwe ulo Chineke, o we me ephod na teraphim, mejue aka nke otù nime umu-ya ndikom, o we ghọrọ ya onye-nchu-àjà.

6 Na mb͕e ahu eze adighi n’Israel: onye ọ bula nēme ihe ziri ezi n’anya-ya.

7 Otù nwa-okorọbia di kwa nke sitere na Bet-lehem-juda, site n’ab͕uru Juda, onye ahu bu onye Livai, ya onwe-ya nānọ kwa dika ọbìa n’ebe ahu.

8 Nwoke ahu we si n’obodo ahu, bú Bet-lehem-juda, je ije inọ dika ọbìa ebe ọ gāchọta ọnọdu: o we ba n’ugwu Efraim rue ulo Maika ime ihe o ji bili ije-ya.

9 Maika we si ya, Òle ebe i si bia? O we si ya, Onye Livai ka m’bu site na Bet-lehem-juda, mu onwem nēje kwa inọ dika ọbia ebe m’gāchọta ọnọdu.

10 Maika we si ya, Biri n’ulom, ghọ-kwa-ram nna na onye-nchu-àjà, mu onwem gēnye kwa gi ego ọla-ọcha iri kwa-arọ, na nke-ekike uwe, na ihe i gēji di ndu. Onye Livai we ba nime.

11 Onye Livai we kwere ibiri n’ulo nwoke; nwa-okorọbia ahu we di ya ka otù nime umu-ya ndikom.

12 Maika we mejue aka onye Livai ahu, nwa-okorọbia ahu we ghọrọ ya onye-nchu-àjà, nọ n’ulo Maika.

13 Maika we si, Ub͕u a ka m’mara na Jehova gēmem nma, n’ihi na onye Livai burum onye-nchu-àjà.

Categories
NDI-IKPE

NDI-IKPE 18

1 Na mb͕e ahu eze adighi n’Israel: na mb͕e ahu ebo ndi Dan nāchọrọ onwe-ha ala-nketa ibiri ebiri; n’ihi na ọ dighi ala bara n’aka-ha n’ihe-nketa n’etiti ebo Israel nile rue ubọchi ahu.

2 Umu Dan we si n’ab͕uru-ha ziga ndikom ise sitere n’ọnu-ọgugu-ha nile, bú ndi-dìnkpà, site na Zọra, site kwa n’Eshtaol, iledo ala ahu, na ileputa ya; ha we si ha, Jenu, leputanu ala ahu: ha we bia ugwu Efraim, rue ulo Maika, nọ ọnọdu-abali n’ebe ahu.

3 Mb͕e ndi ahu nọrọ nso ulo Maika, ha onwe-ha matara olu nwa-okorọbia ahu, bú onye Livai: ha we wezuga onwe-ha ba n’ebe ahu, si ya, Ònye mere ka i bia ebe a? ọ̀ bu kwa gini ka gi onwe-gi nēme n’ebe a? gini ka i nwe-kwa-ra n’ebe a?

4 O we si ha, Otú a na otú a ka Maika meworom, o gowokwam ọlu, m’we ghọrọ ya onye-nchu-àjà.

5 Ha we si ya, Biko, jua Chineke ase, ka ayi we mara ma ije-ayi, bú nke ayi onwe-ayi nēje, gāga nke-ọma.

6 Onye-nchu-àjà ahu we si ha, Jenu n’udo: na ncherita-iru Jehova ka uzọ-unu di, nke unu nēje ije nime ya.

7 Ndikom ise ahu we je, biarue Laish, hu ndi ahu nke bi n’etiti ya, ka ha nēbi na ntukwasi-obi, dika ọme-n’ala ndi Zaidon si di, nādi jū nātukwasi kwa obi; ọ dighi kwa onye nēme ka ihere me ha n’okwu ọ bula n’ala ahu, bú onye nēnweta ike nb͕ochi, n’ebe di ndi Zaidon anya ka ha bi, ọ dighi kwa ihe ha na madu nwekọrọ.

8 Ha we biakute umu-nne-ha rue Zọra na Eshtaol: umu-nne-ha we si ha, Gini ka unu onwe-unu gēkwu?

9 Ha si, Bilie, ka ayi rigo kwa imegide ha: n’ihi na ayi ahuwo ala ahu, ma, le, ọ di nma nke-uku: ùnu onwe-unu nāb͕a kwa nkiti? unu adila ume-ngwu ije na ibà inweta ala ahu.

10 Mb͕e unu biara, unu gābiakute ndi nọ na ntukwasi-obi, ala ahu sara mbara n’aka abua: n’ihi na Chineke enyewo ya n’aka-unu; bú ebe nke ọ nādighi ihe ọ bula nke di n’uwa nakọ n’ebe ahu.

11 Nnù ndikom na ọgu iri ndi ekere ihe-agha, ndi sitere n’ab͕uru ndi Dan, we si n’ebe ahu, bú Zọra na Eshtaol, bulie ije.

12 Ha we rigo, ma ulo-ikwū-ha nime Kiriat-jearim, nime Juda: n’ihi nka ka ha kpọrọ ebe ahu Mahane-dan, rue ta: le, ọ di n’azu Kirian-jearim.

13 Ha we si n’ebe ahu gabiga rue ugwu Efraim, biarue ulo Maika.

14 Ndikom ise ahu, bú ndi nējeri iledo ala Laish, we za, si umu-nne-ha, Ùnu amawo na ephod na teraphim na arusi apiri api na arusi awuru awu di n’ulo ndia? ma ub͕u a, maranu ihe unu gēme.

15 Ha we wezuga onwe-ha ba n’ebe ahu, biarue ulo nwa-okorọbia ahu, bú onye Livai, bú ulo Maika, jua ya ajuju bayere udo-ya.

16 Nnù ndikom na ọgu iri ahu ndi ekere ihe-agha-ha, bú ndi sitere n’umu Dan, nēguzo kwa n’oghere ọnu-uzọ-ama.

17 Ndikom ise ahu, bú ndi nējeri iledo ala ahu, we rigo, ba n’ebe ahu, chiri arusi ahu apiri api, na ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi ahu awuru awu: ma onye-nchu-àjà ahu nēguzo n’oghere ọnu-uzọ-ama, ya na nnù ndikom na ọgu iri ahu ndi ekere ihe-agha.

18 Ma mb͕e ndia bara n’ulo Maika, chiri arusi ahu apiri api, na ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi ahu awuru awu, onye-nchu-àjà ahu we si ha, Gini ka unu onwe-unu nēme?

19 Ha we si ya, B͕a nkiti, kpuchie aka n’ọnu-gi, soro ayi je, ghọ-kwa-ra ayi nna na onye-nchu-àjà: òle nke ka nma, ka i buru onye-nchu-àjà diri ulo nke otù nwoke, ma-ọbu ka i buru onye-nchu-àjà diri otù ebo na otù ab͕uru n’Israel?

20 Obi onye-nchu-àjà ahu we di nma, o we chiri ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi apiri api ahu, ba n’etiti ndi ahu.

21 Ha we chigharia je, tiye umu-ntakiri-ha na unu-ulo-ha na àkù-ha n’iru ha.

22 Mb͕e ndi ahu nọ n’ebe di ulo Maika anya, ndikom ndi nọ n’ulo nile nke di ulo Maika nso we kpọkọta onwe-ha, chukuru umu Dan.

23 Ha we kpọ umu Dan òkù. Ha we chigharia iru-ha, si Maika, Gini nēme gi, na anākpọkọta gi na ndi-gi?

24 Ọ si, Ọ bu chim nke m’mere ka unu chiriworo, ha na onye-nchu-àjàm, unu we la, ma gini ka m’nwere ọzọ? gini bu kwa nka nke unu nāsim, Gini nēme gi?

25 Umu Dan we si ya, Ka aghara inu olu-gi n’etiti ayi, ka ndikom ndi nkpuru-obi-ha di ilu we ghara idakwasi unu, i we kpochapu ndu-gi na ndu ezi-na-ulo-gi.

26 Umu Dan we je ije-ha; Maika we hu na ndi di ike ka ha bu kari ya, o we chigharia lata n’ulo-ya.

27 Ndi ahu we chiri ihe nke Maika mereri, na onye-nchu-àjà nke o nwere, ha we biakwasi Laish, biakwasi otù ndi nādi jū nānọ kwa na ntukwasi-obi, were ọnu mma-agha tib͕ue ha, sure obodo ahu n’ọku.

28 Ma onye-nnaputa adighi, n’ihi na ebe di Zaidon anya ka ọ bu, ọ dighi kwa ihe ha na madu nwekọrọ; ebe ahu di kwa na ndagwurugwu nke di n’akuku Bet-rehob. Ha we wue obodo ahu, biri nime ya.

29 Ha we kpọ aha obodo ahu Dan, n’aha Dan, bú nna-ha, onye amuru nye Israel: otù ọ di, Laish bu aha obodo ahu na mbu.

30 Umu Dan we guzoro onwe-ha arusi ahu apiri api: Jonatan, nwa Giashom, nwa Moses, ya onwe-ya na umu-ya ndikom we buru ndi-nchu-àjà diri ebo Dan rue ubọchi emere ndi ala ahu ka ha je biri n’ala ọzọ.

31 Ha we doro onwe-ha arusi apiri api nke Maika, bú nke o mere, ubọchi nile ulo Chineke di na Shailo.

Categories
NDI-IKPE

NDI-IKPE 19

1 O rue, na mb͕e ahu, mb͕e eze nādighi n’Israel, na otù nwoke, bú onye Livai, di nānọ dika ọbìa n’akuku azu ugwu Efraim, o we si na Bet-lehem-juda kuru n’onwe-ya nwayi bu iko.

2 Iko-ya nwayi ahu we kwa iko megide ya, si n’ebe ọ nọ la n’ulo nna-ya rue Bet-lehem-juda, nọ n’ebe ahu ubọchi ruru ọnwa anọ.

3 Nwoke-ya we bilie, jeso ya, igwa ya okwu gābà ya n’obi, ime ka ọ lata, nwa-okorọbia-ya na inyinya-ibu abua soro kwa ya je: nwayi ahu we me ka ọ ba n’ulo nna-ya: nna nwa-ab͕ọghọ ahu we hu ya, ṅuria izute ya.

4 Ọgọ-ya nwoke, bú nna nwa-ab͕ọghọ ahu, we jide ya; o we nọ n’ulo-ya ubọchi atọ: ha we rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nọ ọnọdu-abali n’ebe ahu.

5 O rue, n’ubọchi nke-anọ, na ha biliri n’isi-ututu, o we bilie ila: nna nwa-ab͕ọghọ ahu we si ọgọ-ya, Were iberibe achicha nwe ume n’obi-gi, ma emesia unu gāla.

6 Ha we nọdu, rikọ ihe, ṅukọ kwa ihe-ọṅuṅu, ha abua: nna nwa-ab͕ọghọ ahu we si nwoke ahu, Biko, kwere, nọ ọnọdu-abali, ka obi-gi di kwa nma.

7 Nwoke ahu we bilie ila; ma ọgọ-ya rugidere ya, o we chigharia nọ ọnọdu-abali n’ebe ahu.

8 O we bilie n’isi-ututu n’ubọchi nke-ise ila; nna nwa-ab͕ọghọ ahu we si, Biko, nwe ume n’obi-gi, o we b͕agwoju ha anya rue mb͕e ubọchi rudara; ha abua we rikọ ihe.

9 Nwoke ahu we bilie ila, ya onwe-ya, na iko-ya nwayi, na nwa-okorọbia-ya; ma ọgọ-ya, bú nna nwa-ab͕ọghọ ahu, siri ya, Biko, le, ike agwu ubọchi, o rubewo anyasi, biko, nọnu ọnọdu-abali: le, ubọchi erudawo, nọ ọnọdu-abali n’ebe a, ka o we diri obi-gi nma; ma bilienu n’isi-ututu echi ije ije-unu, ka i we la n’ulo-ikwū-gi.

10 Ma nwoke ahu ekweghi inọ ọnọdu-abali, kama o biliri la, o we biarue ncherita-iru Jebus (nke ahu bu Jerusalem): inyinya-ibu abua ejikwara ejikwa nēso kwa ya, iko-ya nwayi nēso kwa ya.

11 Mb͕e ndi ahu nọ nso Jebus, ubọchi jemiri nke-uku; nwa-okorọbia ahu we si onye-nwe-ya, Biko, bia, ka ayi wezuga onwe-ayi jerue obodo a nke ndi Jebus, nọ ọnọdu-abali nime ya.

12 Onye-nwe-ya we si ya, Ayi agaghi-ewezuga onwe-ayi jerue obodo onye ala ọzọ, ebe onye sitere n’umu Israel nānọghi; kama ayi gāgabiga rue Gibea.

13 O we si nwa-okorọbia-ya, Bia, ka ayi biarue nso otù nime ebe ndia; ayi gānọ kwa ọnọdu-abali na Gibea, ma-ọbu na Rema.

14 Ha we gabiga, nēje ije-ha; anyanwu we dakpugide ha n’akuku Gibea, nke diri Benjamin.

15 Ha we wezuga onwe-ha ba n’ebe ahu, ibà inọ ọnọdu-abali na Gibea: ọ ba, nọdu n’amá obodo ahu: ma ọ dighi nwoke nāchikọta ha ba n’ulo-ya inọ ọnọdu-abali.

16 Ma, le, otù agadi nwoke siri n’ọlu-ya, bú n’ubi, bia n’anyasi; ma nwoke ahu sitere n’ugwu Efraim, ya onwe-ya nānọ kwa dika ọbìa na Gibea: ma ndikom ebe ahu bu ndi Benjamin.

17 O welie anya-ya abua, hu onye-ije ahu n’amá obodo; agadi nwoke ahu we si, Òle ebe i nēje? òle ebe i si bia kwa?

18 Ọ si ya, Ayi onwe-ayi nēsi na Bet-lehem-juda gabiga rue akuku azu ugwu Efraim; ebe ahu ka m’si bia, m’we je Bet-lehem-juda: ọ bu kwa ulo Chineke ka mu onwem nēje; ma ọ dighi nwoke nāchikọtam na ndim n’ulo-ya.

19 Otú ọ di, ma okporo-ọka ma nri-anu-ulo diri inyinya-ibu-ayi; ọzọ kwa, achicha na manya-vine dirim, di-kwara-ra orù-gi nwayi, di-kwara nwa-okorọbia nke nēso ndi-orù-gi: ọ dighi ihe ọ bula nākọ ayi.

20 Agadi nwoke ahu we si, Udo diri gi; nání, ihe nile nākọ gi dikwasim; nání, anọla ọnọdu-abali n’amá.

21 O we me ka ọ ba n’ulo-ya, gwara inyinya-ibu nri-ha: ha we sa ukwu-ha, rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu.

22 Mb͕e ha onwe-ha nēme ka obi-ha di nma, le, ndikom obodo ahu, bú ndikom jọb͕uru onwe-ha, b͕ara ulo ahu buruburu, nētisi aka ike n’ọnu-uzọ; ha we gwa onye-nwe ulo ahu okwu, bú agadi nwoke ahu, si, Me ka ọ puta, bú nwoke nke bara n’ulo-gi, ka ayi we mara ya.

23 Nwoke ahu, bú onye-nwe ulo, we pukuru ha, si ha, É-è, umu-nnem, biko, unu emela ihe ọjọ; ebe nwoke a bataworo n’ulom, unu emela ihe-nzuzu a.

24 Le, nwam nwayi, bú nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, na iko-ya nwayi; biko, ka m’me ka ha puta, weda-kwa-nu ha n’ala, me ha ihe di nma n’anya-unu: ma unu emela nwoke a ihe-nzuzu a.

25 Ma ndikom ahu ekweghi ige nti ya: nwoke ahu we jide iko-ya nwayi, me ka ọ putara ha n’èzí; ha we mara aru-ya, sob͕ugide ya abali ahu nile rue ututu: ha we zilaga ya na chi-ọbubọ.

26 Nwayi ahu we bia n’isi-ututu, da n’ọnu-uzọ ulo nwoke ahu ebe onye-nwe-ya nọ, rue mb͕e ìhè putara.

27 Onye-nwe-ya we bilie n’ututu, meghe ọnu-uzọ ulo ahu, we pua ije ije-ya: ma, le, nwayi ahu, bú iko-ya, adawo n’ọnu-uzọ ulo ahu, aka-ya abua di kwa na nbata-uzọ.

28 Ọ si ya, Bilie, ka ayi la; ma ọ dighi onye nāza: o we būru ya n’elu inyinya-ibu-ya; nwoke ahu we bilie, je rue ebe nke ya.

29 O we ba n’ulo-ya, were mma, jide iko-ya nwayi, bọ̀ ya, dika ọkpukpu-ya nile si di, n’ọbubọ̀ iri na abua, we zisa ya n’ókè-ala nile nke Israel.

30 O rue, na onye ọ bula nke nāhu ya anya siri, Ọ dighi mb͕e emere ka ihe di otú a di, ahughi kwa ihe di otú a site n’ubọchi umu Israel siri n’ala Ijipt rigota rue ta: tukwasinu uche na ya, b͕anu ìzù, kwu-kwa-nu okwu.

Categories
NDI-IKPE

NDI-IKPE 20

1 Umu Israel nile we puta, ewe kpọkọta nzukọ Israel dika otù nwoke, site na Dan we rue Bia-sheba, ha na ala Gilead, n’ebe Jehova nọ na Mizpa.

2 Ndi-isi ndi Israel nile, bú ebo nile nke Israel, we guzo onwe-ha nime nkpọkọta ndi Chineke, orú nnù ọgu uzọ abua na orú nnù uzọ iri, bú ndi ji ukwu eje, ndi nāmiputa mma-agha.

3 (Ma umu Benjamin nuru na umu Israel arigowo rue Mizpa.) Umu Israel we si, Kwuenu, ìhe ọjọ a si aṅa di?

4 Nwoke ahu, bú onye Livai, di nwayi ahu nke eb͕uru eb͕u, we za, si, Ọ bu Gibea nke diri Benjamin ka m’biara, mu onwem na ikom nwayi, inọ ọnọdu-abali.

5 Ndi-nwe Gibea we bilie megidem, b͕a ulo buruburu imegidem n’abali; mu ka ha chère ib͕u, ikom nwayi ka ha weda-kwa-ra n’ala, o we nwua.

6 M’we jide ikom nwayi, bọ̀ ya abọ̀, zisa ya n’ọhia nile nke ala-nketa Israel: n’ihi na ha emewo ihe-nzube ọjọ na ihe-nzuzu n’Israel.

7 Le, unu nile, bú umu Israel, weputanu okwu na ìzù n’onwe-unu n’ebe a.

8 Ndi Israel nile we bilie dika otù nwoke, si, Ayi agaghi-eje, onye ọ bula n’ulo-ikwū-ya, ayi agaghi-ewezuga kwa onwe-ayi, onye ọ bula ibà n’ulo-ya.

9 Ma ub͕u a nka bu ihe ayi gēme Gibea; ayi gārigo imegide ya n’ofufe-nzà;

10 ayi gēwere kwa ndikom iri nime ọgu ise nke ebo nile nke Israel, na ọgu ise nime nnù abua na ọgu iri, na nnù abua na ọgu iri nime orú nnù na nnù ise, iwetara ndi Israel ihe-oriri-uzọ, ka ha we me, mb͕e ha biaruru Geba Benjamin, dika ihe-nzuzu nile si di nke ha meworo n’Israel.

11 Ndikom nile nke Israel we chikọta onwe-ha imegide obodo ahu, dika otù nwoke ka ejikọtara ha n’otù.

12 Ebo Israel nile we zisa ndikom n’ebo Benjamin, si, Gini bu ihe ọjọ a nke emeworo ka ọ di n’etiti unu?

13 Ma ub͕u a nyenu ayi ndikom ahu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, ndi nọ na Gibea, ka ayi we me ka ha nwua, ka ayi kpochapu kwa ihe ọjọ n’Israel. Ma umu Benjamin ekweghi ige nti olu umu-nne-ha, bú umu Israel.

14 Umu Benjamin we si n’obodo nile ha chikọta onwe-ha rue Gibea, ipu ibuso umu Israel agha.

15 Umu Benjamin we gukọta onwe-ha n’ubọchi ahu site n’obodo nile ha, orú nnù uzọ atọ na nnù ise, bú ndikom nāmiputa mma-agha, nāgughi ndi bi na Gibea, ndi gukọtara onwe-ha, nnù ndikom na ọgu iri-na-ise ndi arọputara arọputa.

16 N’etiti ndi nka nile nnù ndikom na ọgu iri-na-ise ndi arọputara arọputa di, ndi nēme aka-ekpe; onye ọ bula nime ha nāmata otù agiri-isi nkume, ghara imahie.

17 Ma ndikom Israel gukọtara onwe-ha, orú ọgu uzọ abua na orú nnù uzọ iri, bú ndikom nāmiputa mma-agha, nāgughi Benjamin: ndia nile bu ndikom agha.

18 Umu Israel we bilie, rigorue Bet-el, jua Chineke ase; ha we si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi ibuso umu Benjamin agha? Jehova we si, Juda gēbu uzọ.

19 Umu Israel we bilie n’ututu, ma ulo-ikwū-ha megide Gibea.

20 Ndikom Israel we pua ibuso Benjamin agha; ndikom Israel we do agha n’usoro megide ha na Gibea.

21 Umu Benjamin we si na Gibea puta, bibi rue ala n’etiti Israel n’ubọchi ahu orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise.

22 Ndi ahu, bú ndikom Israel, we me onwe-ha ka ha di ike, ha we do kwa agha n’usoro ọzọ n’ebe ha doro onwe-ha n’usoro n’ubọchi mbu.

23 (Umu Israel we rigo, kwa ákwá n’iru Jehova rue anyasi; ha we jua Jehova ase, si, M’gābiaru kwa nso ọzọ ibuso umu Benjamin, bú nwa-nnem, agha? Jehova we si, Rigonu megide ya.)

24 Umu Israel we biarue nso imegide umu Benjamin n’ubọchi nke-abua.

25 Benjamin we si na Gibea puta izute ha n’ubọchi nke-abua ahu, ha we bibie ọzọ rue ala n’etiti umu Israel orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise; ndia nile nāmiputa mma-agha.

26 Umu Israel nile, na ndi ahu nile, we rigo, biarue Bet-el, kwa ákwá, nọdu n’ebe ahu n’iru Jehova, bue ọnu n’ubọchi ahu rue anyasi; ha we sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo n’iru Jehova.

27 Umu Israel we jua Jehova ase, (n’ihi na n’ebe ahu ka ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke di na mb͕e ahu,

28 Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, nēguzo kwa n’iru ya na mb͕e ahu,) si, M’gapu kwa ọzọ ibuso umu Benjamin, bú nwa-nnem, agha, ma-ọbu #m’gāgha? Jehova we si, Rigonu; n’ihi na echi ka M’gēnye ya n’aka-gi.

29 Israel we do ndi nēru nbì megide Gibea buruburu.

30 Umu Israel we rigo megide umu Benjamin n’ubọchi nke-atọ, do onwe-ha n’usoro megide Gibea, dika ha mere ub͕ò abua gara aga.

31 Umu Benjamin we pua izute ndi Israel, ewe dọpu ha n’obodo; ha we malite itib͕u ufọdu n’etiti ndi Israel na ib͕u ha, dika ha mere ub͕ò abua gara aga, n’uzo abua atuliri atuli, nke otù nime ha nārigo Bet-el, otù nārigo kwa Gibea, n’ọhia, ihe ra ka orú ndikom na iri nime Israel.

32 Umu Benjamin we si, Anētib͕u ha n’iru ayi, dika na mbu. Ma umu Israel siri, Ka ayi b͕alaga, si n’obodo dọputa ha n’uzọ atuliri atuli.

33 Ndikom nile nke Israel we si n’ọnọdu-ha bilie, do onwe-ha n’usoro na Beal-tema: ndi Israel ndi nēru nbì nāwaputa kwa n’ọnọdu-ha, na Maare-geba.

34 Orú nnù ndikom na nnù ise ndi arọputara arọputa n’Israel nile we bia na ncherita-iru Gibea, agha ahu we di arọ́: ma ndi Benjamin amaghi na ihe ọjọ nēmetu ha aru.

35 Jehova we tib͕ue Benjamin n’iru Israel: umu Israel we bibie orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri-na-ise nime Benjamin ubọchi ahu: ndia nile nāmiputa mma-agha.

36 Umu Benjamin we hu na etib͕uru ha: n’ihi na ndikom Israel nyere Benjamin uzọ, n’ihi na ha tukwasiri obi na ndi nēru nbì ndi ha doro imegide Gibea.

37 Ndi nēru nbì we je ọsọsọ, made imegide Gibea; ndi nēru nbì we dọrọ onwe-ha rue obodo, were ọnu mma-agha tib͕ue obodo ahu nile.

38 Ma ihe-iriba-ama akara àkà nke diri ndikom Israel na ndi nēru nbì bu nka, na ha gēme ka oké nkwuli anwuru-ọku si n’obodo ahu rigo.

39 Ndikom Israel we chigharia n’agha ahu, Benjamin we malite itib͕u ufọdu n’etiti ndikom Israel na ib͕u ha, ihe ra ka orú ndikom na iri: n’ihi na ha siri, N’ezie ndi etib͕uworo nọ̄ n’iru ayi ka ha bu, dika n’agha mbu.

40 Nkwuli anwuru ahu we malite isi n’obodo ahu rigo, buru ogidi anwuru-ọku, Benjamin we gha anya n’azu ha, ma, le, obodo ahu dum rigoro n’anwuru-ọku rue elu-igwe.

41 Ndikom Israel we chigharia, ndikom Benjamin we ma jijiji: n’ihi na ha huru na ihe ọjọ emetuwo ha aru.

42 Ha we chigharia n’iru ndikom Israel rue uzọ ọzara; ma agha ahu sogidesiri ha ike; ndi siri n’obodo nile puta nēbibi ha n’etiti ha.

43 Ha we b͕a Benjamin buruburu, chua ha, zọkwasi ha ukwu n’ebe-izu-ike-ha, rue na ncherita-iru Gibea n’akuku ọwuwa-anyanwu.

44 Orú nnù ndikom uzò abua na nnù ise nke Benjamin we da; ndia nile bu ndi-dìnkpà.

45 Ha we chigharia b͕alaga n’uzọ ọzara rue nkume di elu, bú Rimon: ha we ghọrọ ha, bú nnù ndikom iri-na-abua na ọgu iri, n’uzọ atuliri atuli, we sogidesi ha ike rue Gidom, tib͕ue nime ha nnù ndikom ise.

46 Ndi nile ndi si na Benjamin da n’ubọchi ahu di orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri ndi nāmiputa mma-agha; ndia nile bu ndi-dìnkpà.

47 Ma nnù ndikom na ọgu iri chighariri b͕alaga n’uzọ ọzara rue nkume di elu, bú Rimon, nọdu na nkume di elu, bú Rimon, ọnwa anọ.

48 Ndikom Israel we laghachikuru umu Benjamin, were ọnu mma-agha tib͕ue ha, site n’obodo ndikom rue anu-ulo na ihe ọ bula nke achọtara achọta; ọzọ kwa, obodo nile nke ha chọtara, ha suru ha ọku.