Categories
NDI-IKPE

NDI-IKPE 1

1 O rue, mb͕e ọnwu Joshua gasiri, na umu Israel juru Jehova ase, si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi imegide ndi Kenean, ibuso ha agha?

2 Jehova we si, Juda gārigo: le, enyewom ala nka n’aka-ya.

3 Juda we si Simeon, bú nwa-nne-ya, Sorom rigo n’ala-ife-nzàm, ka ayi we buso ndi Kenean agha; mu onwem gēsoro kwa gi je n’ala-ife-nzà-gi. Simeon we soro ya je.

4 Juda we rigo; Jehova we nye ndi Kenean na ndi-Perizait n’aka-ha: ha we tib͕ue ha nime Bezek, orú nnù ndikom na nnù ise.

5 Ha we hu Adoni-bezek nime Bezek: ha we buso ya agha, tib͕ue ndi Kenean na ndi-Perizait.

6 Ma Adoni-bezek b͕alagara; ha we chua ya n’azu, jide ya, bipu isi-aka-ya abua na isi-ukwu-ya abua.

7 Adoni-bezek we si, Ọgu eze atọ na iri, ndi ebipuru isi-aka-ha na isi-ukwu-ha, nāchikọta ihe n’okpuru table nkem: dika m’meworo, otú a ka Chineke kwughachiworom. Ha we me ka ọ ba na Jerusalem, ọ nwua n’ebe ahu.

8 Umu Juda we buso Jerusalem agha, were ya, were ọnu nma-agha tib͕ue ya, su obodo ahu ọku.

9 Emesia umu Juda ridara ibuso ndi Kenean agha, bú ndi bi n’ugwu, na nime Negeb, na n’ebe di ala ala.

10 Juda we jekuru ndi Kenean ndi bi na Hebron: (ma aha Hebron na mb͕e gara aga bu Kiriat-aba:) na tib͕ue Sheshai, na Ahiman, na Talmai.

11 O si n’ebe ahu jekuru ndi bi na Debia. (Ma aha Debia na mb͕e ara aga bu Kiriat-sefa.)

12 Keleb we si, Onye ahu nke gētib͕u Kiriat-sefa, were ya, m’gēnye kwa ya Aksa, bú nwam nwayi, na nwunye.

13 Ọtniel nwa Kenaz, nwa-nne ntà Keleb, we were ya: o we nye ya Aksa, bú nwa-ya nwayi, na nwunye.

14 O rue, mb͕e Aksa biara, na ọ kpaliri di-ya iriọ ubi n’aka nna-ya: Aksa we si n’inyinya-ibu-ya rida; Keleb we si ya, Gini ka i nāchọ?

15 Ọ si ya, Nyem ngọzi; n’ihi na ọ bu ala Negeb a ka i nyeworom, gi nyekwam isi miri ufọdu. Keleb we nye ya isi miri di n’elu, na isi miri di n’okpuru.

16 Umu onye-Kinait, bú nna nwunye Moses, we si n’obodo nkwu soro umu Juda rigo n’ọzara Juda, nke di na Ndida nke Arad, ha we je biri n’etiti ndi ahu.

17 Juda we je, ya na Simeon, bú nwa-nne-ya, tib͕ue ndi Kenean ndi bi na Zefat, we wezuga ya ka ebibie ya. Ewe kpọ aha obodo ahu Họma.

18 Juda were kwa Geza na ókè-ala-ya, na Ashkelon na ókè-ala-ya, na Ekron na ókè-ala-ya.

19 Jehova nọye-kwa-ra Juda; o we nweta ugwu; ma ọ pughi inapu ndi bi na ndagwurugwu ala-ha, n’ihi na ha nwere ub͕ọ-ala ígwè.

20 Ha we nye Keleb Hebron, dika Moses kwuru: o we napu umu Anak atọ ala-ha n’ebe ahu.

21 Ma umu Benjamin anapughi ndi Jebus ndi bi na Jerusalem ala-ha: ndi Jebus we biri n’etiti umu Benjamin nime Jerusalem, rue ta.

22 Ma ulo Josef, ha onwe-ha rigoru-kwa-ra Bet-el: Jehova we nọyere ha.

23 Ulo Josef we ziga iledo Bet-el. (Ma aha obodo ahu na mb͕e gara aga bu Luz.)

24 Ndi nēche nche we hu otù nwoke ka o nēsi n’obodo ahu puta, ha we si ya, Biko, gosi ayi nbata obodo a, ayi gēme-kwa-ra gi ebere.

25 Ọ we gosi ha nbata obodo ahu, ha we were ọnu mma-agha tib͕ue obodo ahu; ma ha zipuru nwoke ahu na ab͕uru-ya nile.

26 Nwoke ahu we je ala ndi Het, wue obodo, kpọ aha-ya Luz: nke ahu bu aha-ya rue ta.

27 Manase anapughi ndi bi na Bet-shan na umu-obodo-ya, na ndi bi na Teanak na umu-obodo-ya, na ndi bi na Doa na umu-obodo-ya, na ndi bi na Ibleam na umu-obodo-ya, na ndi bi na Megido na umu-obodo-ya, ala-ha: ma ndi Kenean jisiri ike ibiri n’ala ahu.

28 O rue, mb͕e Israel di ike, na ha tiyere ndi Kenean n’ifè-òfùfè, ma ha anapusighi ha ala-ha.

29 Efraim anapughi kwa ndi Kenean ndi bi na Gezea ala-ha; ndi Kenean we biri na Gezea n’etiti ha.

30 Zebulun anapughi ndi bi na Kitron, na ndi bi na Nahalol, ala-ha; ndi Kenean we biri n’etiti ha, ghọ ndi nọ n’ifè-òfùfè.

31 Asha anapughi kwa ndi bi n’Ako, na ndi bi na Zaidon, na Ahlab, na Akzib, na Helba, na Afik, na Rehob, ala-ha:

32 ndi Asha we biri n’etiti ndi Kenean, bú ndi bi n’ala ahu: n’ihi na ha anapughi ha ala-ha.

33 Naftali anapughi kwa ndi bi na Bet-shemesh, na ndi bi na Bet-anat, ala-ha; ha we biri n’etiti ndi Kenean, bú ndi bi na n’ala ahu: ma ndi bi na Bet-shemesh na Bet-anat ghọrọ ndi nēfè ha òfùfè.

34 Ndi-Amorait we kpagide umu Dan n’ugwu: n’ihi na ha ekweghi ka ha rida na ndagwurugwu:

35 ma ndi-Amorait jisiri ike ibiri n’ugwu Heres, na n’Ajalon, na nime Shaalbim: ma aka ulo Josef dikariri arọ́, ha we ghọ ndi nọ n’ifè-òfùfè.

36 Ókè-ala ndi-Amorait we site na nrigo Akrabim, site na ukume di elu ahu, we rigo.

Categories
NDI-IKPE

NDI-IKPE 2

1 Onye-ozi Jehova we si na Gilgal rigorue Bokim. Ọ we si, Emerem unu ka unu si n’Ijipt rigota, M’we me ka unu bata n’ala nke M’ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha; M’we si, M’gaghi-emebi ọb͕ub͕a-ndum rue mb͕e ebighi-ebi, bú nke Mu ńa unu b͕ara;

2 ma unu onwe-unu na ndi bi n’ala nka ab͕ala ndu; unu gākwatu ebe-ichu-aja nile ha: ma unu egeghi nti olum: gini bu nka unu meworo?

3 M’we si kwa, M’gaghi-achupu ha n’iru unu; kama ha gāburu unu ogwu n’akuku-aru-unu, chi nile ha gābu-kwa-ra unu ọnyà.

4 O rue, mb͕e onye-ozi Jehova gwasiri umu Israel nile okwu ndia, na ndi Israel weliri olu-ha, kwa ákwá.

5 Ha we kpọ aha ebe ahu Bokim: ha we chuara Jehova àjà n’ebe ahu.

6 Joshua we zilaga ndi Israel, umu Israel we la, nwoke ọ bula n’ihe-nketa-ya, inweta ala ahu.

7 Ndi Israel we fè Jehova òfùfè ubọchi nile nke Joshua, na ubọchi nile nke ndi-okenye ndi emere ka ubọchi-ha di anya ka Joshua nwusiri, ndi huru omume uku nile nke Jehova, nke O mere Israel.

8 Joshua nwa Nun, bú orù Jehova, we nwua, mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise na iri.

9 Ha we lìe ya n’ókè-ala nke ihe-nketa-ya nime Timnat-heres, n’ugwu Efraim, n’akuku Ugwu nke ugwu Gaash.

10 Ewe chikọta kwa ọb͕ọ ahu nile na ndi bu nna-ha n’ala-mọ: ọb͕ọ ọzọ we bilie inọchi ha, ndi nāmaghi Jehova, ha amaghi kwa omume nke O mere Israel.

11 Umu Israel we me ihe ọjọ n’anya Jehova, fè Bealim òfùfè:

12 ha we rapu Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, Onye nēme ka ha si n’ala Ijipt puta, ha we jezo chi ọzọ, ndi sitere na chi nke ndi ahu ndi nọ ha gburugburu, ha we kpọ isi ala nye ha: we kpasue Jehova iwe.

13 Ha we rapu Jehova, fè Baal na Ashtarot òfùfè.

14 Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we nye ha n’aka ndi nāpunara madu ihe, ha we punara ha ihe, O renye kwa ha n’aka ndi-iro-ha gburugburu, ha apughi kwa iguzo n’iru ndi-iro-ha ọzọ.

15 Ebe ọ bula ha puru, aka Jehova adigide ha ime ha ihe ọjọ, dika Jehova kwuru, na dika Jehova ṅuru ha iyi: ewe kpab͕ue ha nke-uku.

16 Jehova we me ka ndi-ikpé bilie, ha we zọputa ha n’aka ndi nāpunara ha ihe.

17 Ọzọ kwa, ha egeghi nti ndi-ikpé-ha, n’ihi na ha soro chi ọzọ nākwa iko, we kpọ isi ala nye ha: ha siri n’uzọ ahu wezuga onwe-ha ngwa, bú nke ndi bu nna-ha jere nime ya, n’inu ihe nile Jehova nyere n’iwu; ma ha emeghi otú a.

18 Ma mb͕e Jehova mere ka ndi-ikpe biliere ha, Jehova nọye-kwara-ra onye-ikpe ahu, we zọputa ha n’aka ndi-iro-ha ubọchi nile nke onye-ikpe ahu: n’ihi na Jehova cheghariri uche n’ihi isu-ude-ha n’iru ndi nēmeb͕u ha nākpab͕u kwa ha.

19 O rue, n’ọnwu onye-ikpe ahu, na ha laghachiri, we bibie onwe-ha kari ndi bu nna-ha, n’ijeso chi ọzọ ifè ha òfùfè, na ikpọ isi ala nye ha; ha ekweghi ka ihe si n’omume nile ha, ma-ọbu n’uzọ-ha siri ike, dapu.

20 Iwe Jehova we di ọku megide Israel; O we si, N’ihi na mba nka agabigawo ọb͕ub͕a-ndum nke M’nyeworo ndi bu nna-ha n’iwu, n’ihi na ha egeghi kwa nti olum;

21 Mu onwem agaghi-anapu kwa onye ọ bula ala-ya n’iru ha ọzọ site na mba nile ndi Joshua rapuru mb͕e ọ nwuru:

22 ka M’we were ha nwa Israel, ma ha nēdebe uzọ Jehova ije ije nime ya, dika ndi bu nna-ha debere ya, ma-ọbu na ha edebeghi ya.

23 Jehova we rapu mba ahu, ghara inapu ha ala-ha ngwa ngwa; O nyeghi kwa ha n’aka Joshua.

Categories
NDI-IKPE

NDI-IKPE 3

1 Ma ndia bu mba ndi Jehova rapuru, iji ha nwa Israel, bú ndi nile nāmaghi agha nile nke Kenean;

2 nání ka ọb͕ọ nile nke umu Israel we mara, izí ha agha, nání ndi nāmaghi ha na mb͕e gara aga;

3 bú ndi-isi ise nke ndi Filistia, na ndi Kenean nile, na ndi Zaidon, na ndi-Haivait ndi bi n’ugwu Lebanon, site n’ugwu Beal-heamon rue nbata Hemat.

4 Ha di kwa ka ewere ha nwa Israel, imara ma ha gānu ihe nile Jehova nyere n’iwu, nke O nyere ndi bu nna-ha n’iwu n’aka Moses.

5 Umu Israel we biri n’etiti ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus:

6 ha we lutara onwe-ha umu-ha ndinyom na nwunye, were umu-ha ndinyom nye umu-ha ndikom, fè kwa chi nile ha òfùfè.

7 Umu Israel we me ihe ọjọ n’anya Jehova, chezọ Jehova, bú Chineke-ha, fè Bealim na Asherot.

8 Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we renye ha n’aka Kushan-rishataim, bú eze Mesọpọtemia; umu Israel we fè Kushan-rishataim òfùfè arọ asatọ.

9 Umu Israel we tikue Jehova, Jehova we me ka onye-nzọputa biliere umu Israel, ọ we zọputa ha, bú Ọtniel nwa Kenaz, nwa-nne ntà Keleb.

10 Mọ nke Jehova we dikwasi ya, o we kpe Israel ikpe; ọ pua ibu agha, Jehova we nye Kushan-rishataim, bú eze Mesọpọtemia, n’aka-ya: aka-ya we di ike n’aru Kushan-rishataim.

11 Ala ahu we di jū ọgu arọ abua. Ọtniel nwa Kenaz we nwua.

12 Umu Israel we me kwa ihe ọjọ n’anya Jehova ọzọ: Jehova we me ka Eglon, bú eze Moab, di ike imegide Israel, n’ihi na ha emewo ihe ọjọ n’anya Jehova.

13 O we chikọtara onwe-ya umu Amon na Amalek, je tib͕ue Israel, ha we nweta obodo nkwu ahu.

14 Umu Israel we fè Eglon, bú eze Moab, òfùfè arọ iri na asatọ.

15 Umu Israel we tikue Jehova, Jehova we me ka onye-nzọputa biliere ha, bú Ihud nwa Gira, onye Benjamin, onye nēme aka-ekpe: umu Israel we si n’aka-ya zigara Eglon eze Moab onyinye-inata-iru-ọma.

16 Ihud we mere onwe-ya mma-agha nke nwere ọnu abua, ogologo-ya bu otù cubit; o ke ya n’okpuru uwe-nwuda-ya n’apata-ukwu aka-nri ya.

17 Ọ weta onyinye-inata-iru-ọma ahu nso Eglon eze Moab: ma Eglon bu nwoke mara abuba nke-uku.

18 O rue, mb͕e o wetasiri onyinye-inata-iru-ọma ahu nso, na o zilagara ndi nēbu onyinye-inata-iru-ọma ahu.

19 Ma ya onwe-ya si n’arusi apiri api ndi di na Gilgal laghachi, si, Okwu nzuzo ka m’nwere igwa gi, eze. Ọ si, Nọdunu du. Ndi nile ndi nēguzo ya buruburu we si n’ebe ọ nọ pua.

20 Ihud we biakute ya; ma ya onwe-ya nānọdu nání ya n’ime-ulo-elu ọjuju-oyi nke o nwere. Ihud we si, Okwu Chineke ka m’nwere igwa gi. O we si n’oche-eze-ya bilie.

21 Ihud we setipu aka-ekpe-ya, si n’apata-ukwu aka-nri ya were mma-agha ahu, ma ya n’afọ-ya:

22 isi-mma we soro kwa iru-mma ba; abuba we b͕ochipu iru-mma, na ọ dọputaghi mma-agha ahu n’afọ-ya; o we pua n’otule-ya.

23 Ihud we pua n’uzọ-nbata, mechibido ya ọnu-uzọ ime-ulo-elu ahu, kpachie ha.

24 Ma mb͕e ya onwe-ya pusiri, ndi-orù-ya batara; ha we hu, ma, le, akpachiwo ọnu-uzọ ime-ulo-elu ahu; ha si, Ọ bu nání na o nēkpuchi ukwu-ya abua n’ime-ulo ọjuju-oyi ya.

25 Ha we nēche rue mb͕e ihere mere ha: ma, le, o meghepughi ọnu-uzọ ime-ulo-elu ahu; ha we were nkpisi-ugodi, meghe ha: ma, le, onye-nwe-ha adawo n’ala nwua.

26 Ihud we wepuga onwe-ya mb͕e ọ nāb͕agwoju ha anya, ya onwe-ya we gabiga arusi ahu apiri api, wepuga onwe-ya rue Seira.

27 O rue, mb͕e ọ biara, na ọ fùru opì-ike n’ugwu Efraim, umu Israel we si n’ugwu ahu soro ya rida, ya onwe-ya we nọ n’iru ha.

28 Ọ si ha, B͕asonum n’azu: n’ihi na Jehova enyewo ndi-iro-unu, bú ndi Moab, n’aka-unu. Ha we soro ya rida, were ngabiga-miri Jọdan nile n’uzọ ije Moab, ha ekweghi kwa ka nwoke ọ bula gabiga.

29 Ha we tib͕ue Moab na mb͕e ahu, ihe ra ka orú nnù madu na nnù ise, nwoke ọ bula nke buru ibù, na nwoke ọ bula bu dìnkpà; ọ dighi kwa nwoke ọ bula wepugara onwe-ya.

30 Ewe me ka Moab ruru ala n’okpuru aka Israel n’ubọchi ahu. Ala ahu we di jū ọgu arọ anọ.

31 Mb͕e ọ gasiri Shamga nwa Anat we di, nke were ndudu eji achu ehi tib͕ue ndi Filistia, nnù ndikom na ọgu iri: ya onwe-ya kwa, ọ zọputara Israel.

Categories
NDI-IKPE

NDI-IKPE 4

1 Umu Israel we me kwa ọzọ ihe ọjọ n’anya Jehova, mb͕e Ihud nwusiri.

2 Jehova we renye ha n’aka Jebin, bú eze Kenean, onye bu eze nime Hezoa; onye-isi usuu-ndi-agha-ya bu kwa Sisera, ma onye ahu bi nime Haroshet nke mba di iche iche ọzọ.

3 Umu Israel we tikue Jehova: n’ihi na o nwere nnù ub͕ọ-ala ígwè abua na ọgu ise; ya onwe-ya we meb͕usie umu Israel ike orú arọ.

4 Ma Debora, bú nwayi nke bu onye-amuma, bú nwunye Lapidot, ya onwe-ya nēkpe Israel ikpe na mb͕e ahu.

5 Nwayi ahu bi kwa n’okpuru nkwu Debora n’etiti Rema na Bet-el n’ugwu Efraim: umu Israel we rigokute ya ka o kpe ha ikpe.

6 O zìe kpọ Berak nwa Abinoam ka o si na Kedesh-naftali bia, ọ si ya, Ọ̀ nyeghi iwu, bú Jehova, Chineke nke Israel, si, Je, dọrọ rue n’ugwu Teboa, chiri kwa n’onwe-gi orú nnù ndikom na nnù ise sitere n’umu Naftali, site kwa n’umu Zebulun?

7 M’gadọ kwa Sisera, bú onye-isi usu-ndi-agha Jebin, rue gi aru, rue mìri-iyi Kaishon, ya na ub͕ọ-ala-ya na ìgwè ndi-ya; M’gēnye kwa ya n’aka-gi.

8 Berak we si ya, Ọ buru na i sorom je, m’gēje kwa: ma ọ buru na i soghm je, m’gaghi-eje.

9 Debora we si, Aghaghm isoro gi je: nání na ọjija-gi agaghi-adi n’ije nke gi onwe-gi nēje; n’ihi na ọ bu n’aka nwayi ka Jehova gērenye Sisera. Debora we bilie, soro Berak jerue Kedesh.

10 Berak we kpọkọta Zebulun na Naftali rue Kedesh; o we were ukwu-ya rigo, ya na orú nnù ndikom na nnù ise: Debora we soro ya rigo.

11 Ma Heba, bú onye-Kenait, siri na Ken kewapu onwe-ya, bú site n’umu Hobab nwa-nne nwunye Moses, we ma ulo-ikwū-ya rue osisi terebinth nime Zaananim, nke di n’akuku Kedesh.

12 Ha we gosi Sisera na Berak nwa Abinoam arigowo n’ugwu Teboa.

13 Sisera we kpọkọta ub͕ọ-ala-ya nile, bú nnù ub͕ọ-ala ígwè abua na ọgu ise, na ndi nile ndi soro ya, site na Haroshet nke mba di iche iche ọzọ, rue miri-iyi Kaishon.

14 Debora we si Berak, Bilie; n’ihi na nka bu ubọchi nke Jehova nyeworo Sisera n’aka-gi: Jehova, Ọ̀ pughi we je n’iru gi? Berak we si n’ugwu Teboa rida, ya na orú nnù ndikom na nnù ise ndi soro ya n’azu.

15 Jehova we were ọnu mma-agha chusa Sisera, na ub͕ọ-ala-ya nile, na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, n’iru Berak; Sisera we si n’ub͕ọ-ala-ya rida, b͕alaga n’ukwu-ya.

16 Ma Berak churu ub͕ọ-ala-ya nile n’azu, na n’azu ọmuma-ulo-ikwū-ya, rue Haroshet nke mba di iche iche ọzọ: ọmuma-ulo-ikwū nile nke Sisera we da n’ọnu mma-agha; ọ dighi otù nwoke fọduru.

17 Ma Sisera b͕alagara n’ukwu-ya rue ulo-ikwū Jael, bú nwunye Heba onye-Kenait: n’ihi na udo di n’etiti Jebin, bú eze Hezoa, na ulo Heba, bú onye-Kenait.

18 Jael we pua izute Sisera, si ya, Wezuga onwe-gi, onye-nwem, wezuga onwe-gi bakutem; atula egwu. O we wezuga onwe-ya bakuru ya n’ulo-ikwū, o were ákwà-ichu-oyi kpuchie ya.

19 Ọ si ya, Biko, me ka m’ṅua nwantī miri; n’ihi na akpiri kpọrọm nku. O we meghe karama-akpukpọ miri-ara-ehi, me ka ọ ṅua, o kpuchie ya.

20 Sisera we si ya, Guzo n’ọnu-uzọ ulo-ikwū, o gēru kwa, ọ buru na nwoke ọ bula abia, jua gi, si, Ọ̀ di nwoke ọ bula nọ n’ebe a? na i gāsi, É-è.

21 Jael, bú nwunye Heba, we were ǹtú ulo-ikwū, jide kwa otùtù n’aka-ya, bakuru ya nwayọ, kpọbà ǹtú ahu n’akuku egedege-iru-ya, ǹtú we kpọpue ba n’ala; n’ihi na nwoke ahu di n’oké ura, ike gwu-kwa-ra ya; o we nwua.

22 Ma, le, Berak nāchu Sisera, Jael we puta izute ya, si ya, Bia, m’gēme kwa ka i hu nwoke ahu nke gi onwe-gi nācho. O we bakuru ya; ma, le, Sisera adawo nwua, ǹtú ahu di kwa n’akuku egedege-iru-ya.

23 Chineke we me ka Jebin, bú eze Kenean, ruru ala ubọchi ahu n’iru umu Israel.

24 Aka umu Israel we nāga nēsi ike n’aru Jebin, bú eze Kenean, rue mb͕e ha bipuru Jebin, bú eze Kenean.

Categories
NDI-IKPE

NDI-IKPE 5

1 Debora na Berak nwa Abinoam we bùa abù n’ubọchi ahu, si,

2 N’ihi na ndi-ndú nēdu edu n’Israel,

N’ihi na ndi Israel were afọ-ofufo nye onwe-ha,

Gọzienu Jehova.

3 Nurunu, ndi-eze; ṅanu nti, ndi-isi;

Mu onwem gābùku Jehova abù, ọbuná mu onwem;

M’gābùku Jehova, bú Chineke nke Israel, abù ọma.

4 Jehova, mb͕e I siri na Sia puta,

Mb͕e I siri n’ọhia Edom zọ ije,

Ala mara jijiji, elu-igwe bu-kwa-ra miri,

Igwe-oji nile nke b͕ara ọchichiri bu-kwa-ra miri.

5 Ugwu nile rudara dika miri n’iru Jehova,

Ọbuná Sainai ahu n’iru Jehova, bú Chineke nke Israel.

6 N’ubọchi Shamga nwa Anat,

N’ubọchi Jael, okporo-uzọ nile ghara idi,

Ndi nēje ije n’uzọ we je n’okporo-uzọ b͕agọrọ ab͕agọ.

7 Obodo ntà we ghara idi n’Israel, ha we ghara idi,

Rue mb͕e mu, bú Debora, biliri,

Rue mb͕e mu, bú nne n’Israel, biliri.

8 Ha rọputara chi ọhu di iche iche;

Mb͕e ahu agha di n’ọnu-uzọ-ama nile:

Àhuru ọta ma-ọbu ube

N’etiti orú nnù madu uzọ ise n’Israel?

9 Obim di n’ebe ndi-ònyé-ukpuru nke Israel nọ,

Ndi nēwere afọ-ofufo nye onwe-ha n’etiti ndi Israel:

Gọzienu Jehova.

10 Unu ndi inyinya-ibu ọcha nēbu,

Ndi nānọkwasi n’uwe-nwuda,

Unu na ndi nēje ije n’uzọ,

Tugharinu uche.

11 N’ebe dipuru anya n’olu ndi-uta, n’etiti ebe isere miri,

N’ebe aku ka ha gākọ akukọ ezi omume nile nke Jehova,

Bú ezi omume nile O mere obodo ntà Ya n’Israel.

Mb͕e ahu ndi Jehova ridara rue ọnu-uzọ-ama nile.

12 Teta, teta, Debora;

Teta, teta, kwue okwu abù:

Bilie, Berak, dọta usu ndi i dọtara n’agha n’agha, gi nwa Abinoam.

13 Mb͕e ahu ndi fọduru nime ndi di ike nke-uku, bú ndi Israel, ridara;

Jehova ridara n’ihim imegide ndi-dike.

14 Ndi nkpọrọgwu-ha di nime Amalek siri n’Efraim rida;

Nēso gi n’azu, Benjamin, n’etiti umu-nna-gi.

Ndi-ònyé-ukpuru siri na Makia rida,

Ndi ji nka-n’aka ode-akwukwọ ese ihe si-kwa-ra na Zebulun rida.

15 Ndi-isi n’Isaka nọye-kwa-ra Debora;

Dika Isaka si di, otú a ka Berak di;

Na ndagwurugwu ka ezigara ya n’ukwu-ya abua.

Na miri-iyi nile nke Reuben

Ka oké nzube obi di.

16 N’ìhi gini ka i nọduru n’etiti ogige-aturu-gi,

Inu ob͕ub͕u-ọ̀jà anēb͕uru ìgwè aturu?

Na miri-iyi nile nke Reuben

Ka oké nnyocha obi di.

17 Gilead biri n’ofè Jọdan:

Dan kwa, n’ìhi gini ka ọ nọ n’ub͕o?

Asha nọduru n’ọnu-miri oké osimiri,

Ọ bu kwa n’akuku ọwara-miri-ya nile ka o nēbi.

18 Zebulun bu ndi nyebigara ndu-ha rue ọnwu,

Naftali kwa, n’elu ebe nile di elu nke ọhia.

19 Ndi-eze biara, bū agha;

Mb͕e ahu ndi-eze Kenean būru agha,

Nime Teanak n’akuku miri Megido:

Ọ dighi urù ego ha nara.

20 N’elu-igwe ka ha si bū agha,

Kpakpando si n’uzọ nile ha atuliri atuli buso Sisera agha.

21 Miri-iyi Kaishon bupuru ha,

Miri-iyi ochie ahu, bú miri-iyi Kaishon.

Nkpuru-obim, i nāzọda ike.

22 Mb͕e ahu ka ukwu inyinya zọsiri ike

Site n’iwuli-elu ahu nile, bú iwuli-elu nke ihe nile ya di ike.

23 Buanu Miroz ọnu, ka mọ-ozi nke Jehova siri,

Buanu ndi bi nime ya ọnu nke-uku;

N’ihi na ha abiaghi iyere Jehova aka,

Iyere Jehova aka imegide ndi-dike.

24 Agāgọzi Jael kari ndinyom,

Bú nwunye Heba onye-Kenait,

Kari ndinyom n’ulo-ikwū ka agāgọzi ya.

25 Miri ka Sisera riọrọ, miri-ara-ehi ka ọ nyere ya;

O weta nso ya miri-ara-ehi nke raru araru n’ọkwa ndi di ebube.

26 Aka-ya ka ọ setiri na ǹtú,

Aka-nri-ya n’otùtù ndi nālu ọlu ike;

O were otùtù kpọ Sisera, ọ kpọrọ ya n’isi,

O we kpọpue ya, ǹtú ahu we bapue n’akuku egedege-iru-ya.

27 N’ab͕ata ukwu-ya abua ka o ruru ala, da, tọb͕ọ:

N’ab͕ata ukwu-ya abua ka o ruru ala, da:

Ebe o ruru ala, n’ebe ahu ka ọ dara, la n’iyì.

28 Na window-ya ka ọ lepuru anya, tie nkpu,

Bú nne Sisera, site n’oghere inara ifufe,

Gini mere ub͕o-ala-ya nānọ ọdù ibia?

Gini mere wheel nke ub͕ọ-ala-ya nile ji la azu?

29 Ndi-isi-ya ndinyom ndi mara ihe nāza ya,

E, ya onwe-ya nēkwughachiri onwe-ya okwu-ọnu-ya nile,

30 Hà achọtaghi? hà ekèghi ihe-nkwata?

Otù nwa-ab͕ọghọ, umu-ab͕ọghọ abua, gādiri nwoke ọ bula, n’isi n’isi;

Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji, diri Sisera,

Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma,

Bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma n’akuku abua, nke diri olu ndi akwatara?

31 Otú a ka ndi-iro-Gi nile gāla n’iyi, Jehova:

Ma ndi nāhu Ya n’anya gādi ka anyanwu mb͕e ọ nāputa n’ike-ya.

Ala we di jū ọgu arọ abua.

Categories
NDI-IKPE

NDI-IKPE 6

1 Umu Israel we me ihe ọjọ n’anya Jehova: Jehova we nye ha n’aka Midian arọ asa.

2 Aka Midian we di ike n’aru Israel: n’ihi Midian ka umu Israel mere onwe-ha ebe miri nērù nke di n’ugwu, na ọb͕à, na ebe ewusiri ike.

3 O rue, ọ buru na Israel agha nkpuru, na ndi Midian rigoro ya, na ndi Amalek, na umu Iru-anyanwu; ha we rigo imegide ha;

4 ha we ma ulo-ikwū-ha imegide ha, we bibie ihe-omume ala, rue ebe i gābà na Geza, ha arapughi kwa ihe nēdebe ndu n’Israel, ma ọ bu aturu, ma-ọbu ehi, ma-ọbu inyinya-ibu.

5 N’ihi na ha na anu-ulo-ha na ulo-ikwū nile ha rigoro, ha batara dika ojuju igurube n’iba-uba; ọnu-ọgugu adighi kwa ha, ọ dighi kwa camel-ha: ha we bata n’ala ibibi ya.

6 Ewe me ka Israel ghara inwe ike ma ọli n’ihi Midian; umu Israel we tikue Jehova.

7 O rue, mb͕e umu Israel tikuru Jehova n’ihi Midian,

8 na Jehova ziri otù nwoke, bú onye-amuma, jekuru umu Israel: ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Mu onwem mere ka unu si n’Ijipt rigota, eme-kwa-ram ka unu si n’ulo ndi-orù puta:

9 M’we naputa unu n’aka ndi Ijipt, na n’aka ndi nile nēmeb͕u unu, M’we chupu ha n’iru unu, nye unu ala-ha:

10 M’we si unu, Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu; unu atula egwu chi nile nke ndi-Amorait, ndi unu onwe-unu bi n’ala-ha: ma unu egeghi nti olum.

11 Mọ-ozi nke Jehova we bia, nọdu n’okpuru osisi terebinth ahu nke di n’Ọfra, nke Joash, bú onye Abieza, nwere: ma Gideon nwa-ya nēticha ọka wheat n’ebe-nzọcha-nkpuru-vine, iwepu ya n’iru Midian.

12 Mọ-ozi nke Jehova we me ka ọ hu ya anya, si ya, Jehova nọyere gi, gi dike bu dìnkpà.

13 Gideon we si ya, Biko, onye-nwem, ọ buru na Jehova nọyere ayi, n’ìhi gini kwa ka ihe a nile dakwasiworo ayi? òle ebe kwa ka ihe-ebube-Ya nile di, nke nna-ayi-hà kọrọ ayi akukọ ha, si, Jehova, Ọ̀ meghi ka ayi si n’Ijipt rigota? ma ub͕u a Jehova arapuwo ayi, nye kwa ayi n’aka Midian.

14 Jehova we che ya iru, si, Je n’ike-gi a, zọputa Israel n’aka Midian: èzigaghm i?

15 Ọ si Ya, Biko, Onye-nwe-ayi, #M’gēji gini zọputa Israel? le, usu nnù ndikom abua na ọgu iri nkem bu nke nēnweghi ike nime Manase, mu onwem bu kwa onye pekasiri npe n’ulo nnam.

16 Jehova we si ya, N’ihi na Mu na gi gānọ, i gētib͕u kwa Midian dika otù nwoke.

17 Ọ si ya, Biko, ọ buru na ahutawom amara n’iru Gi, Gi me-kwa-ram ihe-iriba-ama na Gi onwe-gi nākpayerem uka.

18 Biko, esila n’ebe a pua, rue mb͕e m’gābiakute Gi, weputa onyinyem inata iru-ọma, dọba ya n’iru Gi. Ọ si, Mu onwem gānọdu rue mb͕e i gābiaghachi.

19 Gideon we ba n’ulo, dozie nwa-ewu, na achicha ekoghi-eko nke ephah utu ọka: o tiyere anu ahu nime nkata, tiye kwa ofè n’ite, weputa ya nye ya n’okpuru osisi terebinth ahu, we weta ya nso.

20 Mọ-ozi nke Chineke we si ya, Were anu nka na achicha ekoghi-eko nka, dọba n’elu nkume a di elu, wusi kwa ofé. O me otú a.

21 Mọ-ozi nke Jehova we setipu nsọtu nkpa-n’aka nke di n’aka-ya, metu anu ahu na achicha ekoghi-eko ahu; ọku we si na nkume ahu di elu rigo, ripia anu ahu na achicha ekoghi-eko; mọ-ozi nke Jehova we pua n’anya-ya.

22 Gideon we hu na mọ-ozi nke Jehova ka ọ bu; Gideon we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! n’ihi na ahuwom mọ-ozi nke Jehova iru n’iru.

23 Jehova we si ya, Udo diri gi; atula egwu: i gaghi-anwu.

24 Gideon we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n’ebe ahu, kpọ ya Jehova-shalom: rue ta ọ digide n’Ọfra nke ndi Abieza.

25 O rue, n’abali ahu, na Jehova siri ya, Were oke-ehi nke nna-gi nwere, bú oke-ehi nke-abua, nke b͕ara arọ asa, kwadà kwa ebe-ichu-àjà Beal nke nna-gi nwere, b͕utu kwa Ashera nke di n’akuku ya:

26 wu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ebe-ichu-àjà n’elu ebe a siri ike, n’usoro, were kwa oke-ehi nke-abua ahu, were kwa nkù Ashera nke i gēb͕utu, sure àjà-nsure-ọku.

27 Gideon we chiri ndikom iri sitere na ndi-orù-ya, o me dika Jehova gwara ya okwu: o rue, n’ihi na ọ turu egwu ulo nna-ya na ndikom obodo-ya, ime ya n’ehihie, na o mere ya n’abali.

28 Ndikom obodo ahu we bilie n’isi-ututu, ma, le, akwaturu ebe-ichu-àjà Beal, b͕utu kwa Ashera nke di n’akuku ya, sure kwa oke-ehi nke-abua ahu n’elu ebe-ichu-àjà nke ewuru.

29 Ha we sirita onwe-ha, Ònye mere ihe a? Ha we jua ajuju, chọ kwa, si, Gideon nwa Joash emewo ihe a.

30 Ndikom obodo ahu we si Joash, Me ka nwa-gi puta, ka ọ nwua: n’ihi na ọ kwatuwo ebe-ichu-àjà Beal, na n’ihi na o b͕utuwo Ashera nke di n’akuku ya.

31 Joash we si ndi nile nke guzoro megide ya, Unu onwe-unu, ùnu gēkpere Beal ọnu-ya? ma-ọbu unu onwe-unu, ùnu gāzọputa ya? Onye nke gēkpere ya ọnu-ya, ka eme ka ọ nwua: rapu ya rue ututu; ọ buru na chi ka ọ bu, ya kpere onwe-ya ọnu-ya, n’ihi na akwatuwo ebe-ichu-àjà-ya.

32 Ọ we kpọ ya Jerubeal n’ubọchi ahu, si, Ka Beal kpegide ya, n’ihi na ọ kwatuwo ebe-ichu-àjà-ya.

33 Ndi Midian nile na ndi Amalek na umu Iru-anyanwu we chikọta onwe-ha, gabiga, ma ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Jezreel.

34 Mọ nke Jehova we were Gideon kpuchie Onwe-ya dika uwe; o we fùa opì-ike; Abieza we kpọkọta onwe-ha n’azu ya.

35 O we ziga ndi-ozi nime Manase nile; ha onwe-ha kpọkọta-kwa-ra onwe-ha n’azu ya: o we ziga ndi-ozi nime Asha, na nime Zebulun, na nime Naftali; ha we rigo izute ha.

36 Gideon we si Chineke, Ọ buru na I nēsi n’akam zọputa Israel, dika I kwuworo,

37 le, mu onwem nētiye aji-anu ebìri ebì n’ebe-nzọcha-ọka; ọ buru na igirigi adikwasi nání n’aji-anu ebìri ebì ahu, ma ọkpukpọ-nku adikwasi n’ala nile buruburu, m’gāmara kwa na I gēsi n’akam zọputa Israel, dika I kwuworo.

38 O we di otú a: o we bilie n’isi-ututu n’echi-ya, pikọta aji-anu ebìri ebì ahu, hichapu igirigi n’aji-anu ebìri ebì ahu, ojuju ọkwa miri.

39 Gideon we si Chineke, Ka iwe-Gi ghara idi ọku megidem, ka m’kwu kwa nání otù ub͕ò a: biko, ka m’were aji-anu ebìri ebì ahu nwa nání otù ub͕ò a; biko, ka ọkpukpọ-nku dikwasi nání n’aji-anu ebìri ebì ahu, ma ka igiriri dikwasi n’ala nile buruburu.

40 Chineke we me otú a n’abali ahu: ọkpukpọ-nku we dikwasi nání n’aji-anu ebìri ebì ahu, ma igirigi dikwasiri n’ala nile buruburu.

Categories
NDI-IKPE

NDI-IKPE 7

1 Jerubeal (onye ahu bu Gideon), na ndi nile soro ya, we bilie n’isi-ututu, ma ulo-ikwū-ha n’akuku isi-iyi Harod: ọmuma-ulo-ikwū Midian we di n’akuku Ugwu ha, site n’ugwu ntà More, nime ndagwurugwu.

2 Jehova we si Gideon, Ndi nke nēso gi baram uba inye Midian n’aka-ha, ka Israel we ghara inya isi megidem, si, Akam azọputawom.

3 Ma ub͕u a, biko, kpọ òkù na nti ndi nka, si, Ònye nātu egwu, nāma kwa jijiji? ya laghachi, si n’ugwu Gilead b͕alaga. Orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise we si na ndi Israel laghachi; ma orú nnù ndikom na nnù ise fọduru.

4 Jehova we si Gideon, Ndi Israel bara uba rue ub͕u a; me ka ha ridarue miri ahu, M’gānwaputa-kwa-ra gi ha n’ebe ahu: ọ gēru kwa, na onye ọ bula M’gāsi gi, Onye a gēsoro gi je, ọ bu onye ahu gēsoro gi je; ma onye ọ bula M’gāsi gi, Onye a agaghi-eso gi je, ọ bu onye ahu nāgaghi-eje.

5 O we me ka ndi Israel ridarue miri ahu: Jehova we si Gideon, Onye ọ bula nke ji ire-ya ra miri, dika nkita nāra, onye ahu ka i gēdo n’onwe-ya iche; onye ọ bula kwa nke nēruru n’ikperè-ya abua iṅu miri.

6 Ọnu-ọgugu ndi nāra miri, n’itiye aka-ha n’ọnu-ha, di ọgu ndikom iri-na-ise: ma ndi nile fọduru nime ndi Israel ruru n’ikperè-ha iṅu miri.

7 Jehova we si Gideon, Ọ bu ọgu ndikom iri-na-ise ahu ndi nāra miri ka M’gēji zọputa unu, nye kwa Midian n’aka-gi; ma ka ndi Israel nile la, onye ọ bula n’ebe nke ya.

8 Ndi ahu we were ihe-oriri-uzọ n’aka-ha, na opì-ike-ha: ma o zilagara ndikom nile nke Israel, onye ọ bula n’ulo-ikwū-ya, ma ọgu ndikom iri-na-ise ahu ka o jidere: ma ọmuma-ulo-ikwū Midian di n’okpuru ya nime ndagwurugwu ahu.

9 O rue, n’abali ahu, na Jehova siri ya, Bilie, rida imegide ọmuma-ulo-ikwū ahu; n’ihi na enyewom ya n’aka-gi.

10 Ma ọ buru na gi onwe-gi atua egwu irida, gi na Pura, bú nwa-okorọbia-gi, ridarue ọmuma-ulo-ikwū ahu:

11 i gānu kwa ihe ha nēkwu: emesia agēme kwa ka aka-gi abua di ike ka i we rida imegide ọmuma-ulo-ikwū ahu. O we rida, ya onwe-ya na Pura, bú nwa-okorọbia-ya, rue nsọtu ndi chiri ihe-ekike-agha, ndi nọ n’ọmuma-ulo-ikwū ahu.

12 Ma ndi Midian na ndi Amalek na umu Iru-anyanwu nile nāmade nime ndagwurugwu ahu dika igurube n’uba; iguta-ọgugu adighi kwa camel-ha, dika ájá nke di n’usọ oké osimiri n’uba.

13 Gideon we bia, ma, le, otù nwoke nēzere ibe-ya nrọ, si, Le, arọrọm nrọ, ma, le, buruburu achicha ọka barley nākpọre ba n’ọmuma-ulo-ikwū Midian, ọ biarue ulo-ikwū, tie ya, o we da, achicha ahu we me ka o kpue iru, ulo-ikwū ahu we tọb͕ọ n’ala.

14 Ibe-ya we za, si, Nka abughi ihe ọzọ ma-ọbughi mma-agha Gideon nwa Joash, bú nwoke Israel: Chineke enyewo Midian na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile n’aka-ya.

15 O rue, mb͕e Gideon nuru ọzize nrọ ahu na akukọ-isi-ya, na ọ kpọrọ isi ala; o we laghachi n’ọmuma-ulo-ikwū Israel, si, Bilienu; n’ihi na Jehova enyewo ọmuma-ulo-ikwū Midian n’aka unu.

16 O we kewa ọgu ndikom iri-na-ise ahu n’usu atọ, o tiye n’aka-ha nile opì-ike, na ite nke ihe nādighi nime ha, na ọwa n’etiti ite ahu.

17 Ọ si ha, Lenum anya, me-kwa-unu otú a: ma, le, mb͕e mu onwem nābà na nsọtu ọmuma-ulo-ikwū-ha, ọ gēru kwa na, dika m’nēme, otú a ka unu gēme.

18 Mb͕e m’fùru opì-ike, mu onwem na ndi nile nke sorom, unu gāfù kwa opì-ike, ọbuná unu onwe-unu, buruburu ọmuma-ulo-ikwū ahu nile, si, Ayi diri Jehova, di-kwa-ra Gideon.

19 Gideon, na ọgu ndikom ise ndi soro ya, we ba na nsọtu ọmuma-ulo-ikwū na nmalite nche etiti abali, (ọ bu nání mb͕e ahu ka ha guzoro ndi-nche): ha we fùa opì-ike-ha, tupia kwa ite nke di n’aka-ha.

20 Usu atọ ahu we fùa opì-ike-ha, tiwa kwa ite-ha, jide kwa ọwa-ha n’aka-ekpe-ha, na opì-ike-ha n’aka-nri-ha, ifù afù: ha we tie nkpu, si, Mma-agha diri Jehova di-kwa-ra Gideon.

21 Ha we guzo, nwoke ọ bula n’ọnọdu-ya, buruburu ọmuma-ulo-ikwū ahu: ọmuma-ulo-ikwū ahu nile we b͕a ọsọ; ha we tie nkpu, b͕alaga.

22 Ha we fùa ọgu opì-ike iri-na-ise ahu, Jehova we me ka mma-agha nwoke ọ bula di n’aru ibe-ya, na n’aru ọmuma-ulo-ikwū ahu nile: ọmuma-ulo-ikwū ahu we b͕alaga rue Bet-shita n’uzọ Zerera, rue uzọ Ebel-mehola, n’akuku Tabat.

23 Ndikom Israel we si Naftali, na n’Asha, na nime Manase nile, kpọkọta onwe-ha, chua Midian n’azu.

24 Gideon we ziga ndi-ozi n’ugwu Efraim nile, si, Ridatanu izute Midian, burunu ha uzọ were miri, rue Bet-bara, bú Jọdan. Ndikom nile nke Efraim we kpọkọta onwe-ha, were miri ahu rue Bet-bara, bú Jọdan.

25 Ha we nwude ndi-isi abua nke Midian, bú Oreb na Zeeb; ha we b͕ue Oreb n’oke nkume Oreb, b͕u kwa Zeeb n’ebe-nzọcha-nkpuru-vine nke Zeeb, we chua Midian: ha we wetara Gideon isi Oreb na Zeeb n’ofè Jọdan.

Categories
NDI-IKPE

NDI-IKPE 8

1 Ndikom Efraim we si ya, Gini bu ihe a i meworo ayi, na i kpọghi ayi, mb͕e i jere ibuso Midian agha? Ha we soro ya isesi okwu ike.

2 Ọ we si ha, Gini ka m’meworo ub͕u a dika nke unu mere? Ntutukọ nkpuru ubi-vine fọduru nke Efraim, ọ̀ dighi nma kara ọghughọ-nkpuru-vine nke Abieza?

3 N’aka-unu ka Chineke nyeworo ndi-isi Midian, bú Oreb na Zeeb: ma gini ka m’puru ime dika nke unu mere? Mb͕e ahu obi-ọku-ha juru n’aru ya, mb͕e o kwuru okwu ahu.

4 Gideon we biarue Jọdan igabiga, ya onwe-ya, na ọgu ndikom iri-na-ise ahu ndi soro ya, ha nāda #mbà, ma ha nāchu achu.

5 O we si ndikom Sukot, Biko, nyenu ndi nēsom n’ukwu n’ukwu ob͕e achicha; n’ihi na ha nāda #mbà, ma mu onwem nāchu Zeba na Zalmuna, bú ndi-eze Midian.

6 Ndi-isi Sukot we si, Ọbu-aka Zeba na Zalmuna, hà di n’aka-gi ub͕u a, na ayi gēnye usu-ndi-agha-gi nri?

7 Gideon we si, N’ihi nka mb͕e Jehova gēnye Zeba na Zalmuna n’akam, m’gēwere kwa ogwu nke ọzara were kwa ùgà ticha anu-aru-unu.

8 O si n’ebe ahu rigorue Penuel, gwa ha okwu dika nka: ndikom Penuel we za ya dika ndikom Sukot zara ya.

9 O we gwa kwa ndikom Penuel okwu, si, Mb͕e m’latara n’udo, m’gākwatu ulo-elu a.

10 Ma Zeba na Zalmuna nọ nime Kakoa, ha na ọmuma-ulo-ikwū nile ha, ihe ra ka orú nnù ndikom, na nnù iri-na-asa, na ọgu iri, ndi fọduru site n’ọmuma-ulo-ikwū nile nke umu Iru-anyanwu: ma ndi daworo di orú nnù ndikom uzọ iri-na-ise, ndi nāmiputa mma-agha.

11 Gideon we rigo n’uzọ ndi bi n’ulo-ikwū n’Iru-anyanwu Noba na Jọgbeha, o tib͕ue ọmuma-ulo-ikwū ahu; n’ihi na ọmuma-ulo-ikwū ahu nọ na ntukwasi-obi na ihe agaghi-eme ha.

12 Ma Zeba na Zalmuna b͕alagara; o we chua ha; o we nwude ndi-eze abua nke Midian, bú Zeba na Zalmuna, me ka ọmuma-ulo-ikwū ahu nile ma jijiji.

13 Gideon nwa Joash we si n’agha ahu site na nrigo Heres lata.

14 Ọ nwude otù nwa-okorọbia sitere na ndikom Sukot, o we jua ya ajuju: o we dere ya aha ndi-isi Sukot na ndi-okenye-ya n’akwukwọ, ọgu ndikom atọ na iri na asa.

15 O we biakute ndikom Sukot, si, Le Zeba na Zalmuna, ndi unu taram uta bayere ha, si, Ọbu-aka Zeba na Zalmuna, hà di n’aka-gi ub͕u a, na ayi gēnye ndikom-i ndi nāda #mbà nri.

16 O were ndi-okenye obodo ahu, na ogwu ọzara na ùgà, o were ha me ka ndikom Sukot mara ihe.

17 Ọ kwatu ulo-elu Penuel, b͕ue ndikom obodo ahu.

18 Ọ si Zeba na Zalmuna, Ndikom ahu nke unu b͕uru nime Teboa, hà di aṅa? Ha si, Dika i di, otú a ka ha di; onye ọ bula di ka umu eze n’aru.

19 Ọ si, Umu-nnem, bú umu-ndikom nnem muru, ka ha bu: Jehova nādi ndu! asi na unu emewo ka ha di ndu, agaghm-eb͕uwori unu.

20 O we si Jeta, bú ọkpara-ya, Bilie, b͕ue ha. Ma nwa-okoro ahu amiputaghi mma-agha-ya: n’ihi na ọ nātu egwu, n’ihi na nání nwa-okoro ka ọ bu rue mb͕e ahu.

21 Zeba na Zalmuna we si, Gi onwe-gi bilie, dakwasi ayi: n’ihi na dika nwoke si di, otú a ka idi-ike-ya di. Gideon we bilie, b͕ue Zeba na Zalmuna, were ihe nile yiri ọnwa nke di n’olu camel-ha.

22 Ndikom Israel we si Gideon, Nāchi ayi, ma gi onwe-gi, ma nwa-gi nwoke, ma nwa nwa-gi: n’ihi na i zọputawo ayi n’aka Midian.

23 Gideon we si ha, Mu onwem agaghi-achi unu, nwam agaghi-achi kwa unu: Jehova gāchi unu.

24 Gideon we si ha, Ka m’riọ unu aririọ, nye-kwa-num, nwoke ọ bula nb͕a-aka nke ihe-nkwata-ya. (N’ihi ma ha nwere nb͕a-aka ọla-edo, n’ihi na ndi Ishmael ka ha bu.)

25 Ha si, Ayi gēnye ha nọ̄. Ha we b͕asa uwe, tubà n’ebe ahu, nwoke ọ bula nb͕a-aka nke ihe-nkwata-ya.

26 Ọtùtù nb͕a-aka ọla-edo nile nke ọ riọrọ we di nnù shekel ọla-edo anọ na ọgu ise; nāgughi ihe nile yiri ọnwa, na ihe nile anākwuba na nti, na uwe ododo nile nke di n’aru ndi-eze Midian, nāgughi kwa ihe-inya-n’olu nile nke di n’olu camel-ha.

27 Gideon we me ya ka ọ buru ephod, guzo ya ọtọ n’obodọ-ya, bú Ọfra: Israel nile we soro ya nākwa iko n’ebe ahu: o we ghọrọ Gideon, ghọ-kwa-ra ulo-ya, ọnyà.

28 Ewe me ka Midian ruru ala n’iru umu Israel, ha ewelighi kwa isi-ha ọzọ. Ala we di jū ọgu arọ abua n’ub͕ochi Gideon.

29 Jerubeal nwa Joash we je biri n’ulo-ya.

30 Gideon nwe-kwa-ra ọgu umu-ndikom atọ na iri ndi siri n’úkwù onwe-ya puta: n’ihi na ọ nwere ọtutu ndinyom.

31 Iko-ya nwayi nke nọ na Shekem, ya onwe-ya mu-kwa-ra ya nwa-nwoke, ọ gua ya aha Abimelek.

32 Gideon nwa Joash we nwua n’ezi isi-awọ, elìe ya n’ílì Joash, bú nna-ya, n’Ọfra nke ndi Abieza.

33 O rue, mb͕e Gideon nwuru, na umu Israel laghachiri, soro Bealim nākwa iko, doro onwe-ha Beal-berit ka ọ buru chi.

34 Ma umu Israel echetaghi Jehova, bú Chineke-ha, Onye nānaputa ha n’aka ndi-iro-ha nile buruburu:

35 ha emeghi kwa ulo Jerubeal, bú Gideon, ebere, dika ezi ihe nile si di nke o mere Israel.

Categories
NDI-IKPE

NDI-IKPE 9

1 Abimelek nwa Jerubeal we jerue Shekem, jekuru umu-nne nne-ya, gwa ha okwu, gwa kwa ab͕uru nile nke ulo nna nne-ya, si,

2 Biko, kwuenu na nti ndi nile nwe Shekem, si, Òle nke diri unu nma? na ọgu ndikom atọ na iri, bú umu-ndikom nile nke Jerubeal, nāchi unu, ma-ọbu na otù nwoke nāchi unu? cheta-kwa-unu na ọkpukpu-unu na anu-aru-unu ka m’bu.

3 Ume-nne nne-ya kwue okwu ndia nile bayere ya na nti ndi nile nwe Shekem: obi-ha we wezuga onwe-ha iso Abimelek; n’ihi na ha siri, Nwa-nne-ayi ka ọ bu.

4 Ha we nye ya ọgu ọla-ọcha atọ na iri sitere n’ulo Beal-berit, nke Abimelek ji go ndikom efu ndi obi-ha nādighi adi n’otù ebe, ha we jeso ya.

5 O we ba n’ulo nna-ya n’Ọfra, b͕ue umu-nne-ya, bú umu Jerubeal, ọgu madu atọ na iri, n’elu otù nkume: ma Jotam nwa Jerubeal nke-ntà fọduru; n’ihi na o zoro onwe-ya.

6 Ndi nile nwe Shekem we chikọta onwe-ha, ha na ulo nile nke Milo, ha we je me Abimelek ka ọ buru eze, n’akuku osisi terebinth nke ogidi ahu nke di na Shekem.

7 Ha we gosi ya Jotam, o we je guzo n’elu ugwu Geraizim, welie olu-ya, kpọ, si ha, Genum nti, unu ndi-nwe Shekem, ka Chineke we ge unu nti.

8 Osisi jere eje ite otù onye manu ka ọ buru eze-ha; ha we si osisi olive, Buru eze-ayi.

9 Osisi olive we si ha, M’gāgha manu nkem, bú nke ha ji sọpuru Chineke na madu nimem, je ifeghari n’elu osisi nile?

10 Osisi nile we si osisi fig, Gi onwe-gi bia, buru eze-ayi.

11 Osisi fig we si ha, M’gagha utọm na ezi ihe-ọmimim, je ifeghari n’elu osisi nile?

12 Osisi nile we si osisi vine, Gi onwe-gi bia, buru eze-ayi.

13 Osisi vine we si ha, M’gāgha manya ọhu nkem, bú nke nēme ka Chineke na madu ṅuria ọṅu, je ifeghari n’elu osisi nile?

14 Osisi nile we si ogwu, Gi onwe-gi bia, buru eze-ayi.

15 Ogwu we si osisi nile, Ọ buru na ọ bu n’ezi-okwu ka unu onwe-unu nētem manu iburu unu eze, bianu, b͕abànu n’okpuru ndo nkem: ma ọ buru na ọ bughi n’ezi-okwu, ka ọku si n’ogwu puta, ripia osisi cedar nile nke Lebanon.

16 Ma ub͕u a, ọ buru na ọ bu n’ezi-okwu na n’izu-okè ka unu meworo ihe a, na unu emewo Abimelek eze, ọ buru kwa na ọ bu ezi ihe ka unu meworo Jerubeal, me kwa ulo-ya, ọ buru kwa na ọ bu dika nmeso aka-ya abua si di ka unu meworo ya;

17 (n’ihi na nnam būru agha bayere unu, tufue ndu-ya n’iru ya, we naputa unu n’aka Midian:

18 ma unu onwe-unu ebiliwo imegide ulo nnam ta, b͕u kwa umu-ya ndikom, bú ọgu ndikom atọ na iri, n’elu otù nkume, me kwa Abimelek, bú nwa orù-ya nwayi, eze ndi-nwe Shekem, n’ihi na nwa-nne-unu ka ọ bu;)

19 ma ọ buru na ọ bu n’ezi-okwu na n’izu-okè ka unu meworo Jerubeal, me kwa ulo-ya, ta, ṅurianu ọṅu n’Abimelek, ka ọ ṅuria kwa nime unu, ọbuná ya onwe-ya:

20 ma ọ buru na ọ bughi otú a, ka ọku si n’Abimelek puta, ripia ndi-nwe Shekem, na ulo Milo; ka ọku si kwa na ndi-nwe Shekem puta, si kwa n’ulo Milo puta, ripia Abimelek.

21 Jotam we b͕alaga, b͕apu, jerue Bia, biri n’ebe ahu, n’ihi Abimelek, bú nwa-nne-ya.

22 Abimelek we buru onye-isi Israel arọ atọ.

23 Chinek we zite mọ ọjọ n’etiti Abimelek na ndi-nwe Shekem; ndi-nwe Shekem we ghọb͕ue Abimelek:

24 ka ihe-ike emere ọgu umu-ndikom Jerubeal atọ na iri we bia, ka ewe tukwasi kwa ọbara-ha n’isi Abimelek, bú nwa-nne-ha, onye b͕uru ha, na n’isi ndi-nwe Shekem, ndi mere ka aka-ya abua di ike ib͕u umu-nne-ya.

25 Ndi-nwe Shekem we do ndi nēruru ya nbì n’elu ugwu nile ha, ha we punara onye ọ bula nke nāgabiga n’uzọ ahu n’akuku ha ihe: ewe gosi Abimelek.

26 Geal nwa Ebed we bia, ya na umu-nne-ya, ha we gabiga ba Shekem: ndi-nwe Shekem we tukwasi ya obi.

27 Ha we pua ba n’ubi, ghọ nkpuru ubi-vine nile ha, zọcha nkpuru-vine, me ememe otuto, ba n’ulo chi-ha, rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, kọcha Abimelek.

28 Geal nwa Ebed we si, Ònye bu Abimelek, ònye bu kwa Shekem, na ayi gēfè ya òfùfè? ọ̀ bughi nwa Jerubeal? Zebul kwa, ọ̀ bughi onye-nlekọta ihe-ya? fènu ndikom Hemoa, bú nna Shekem, òfùfè: ma gini mere ayi onwe-ayi nēfè ya òfùfè?

29 Ma ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndi nka nọ n’akam! m’gēwezuga kwa Abimelek. O we si Abimelek, Me ka usu-ndi-agha-gi ba uba, gi puta kwa.

30 Zebul, bú onye-isi obodo ahu, we nu okwu nile nke Geal nwa Ebed, iwe-ya we di ọku.

31 O we zigara Abimelek ndi-ozi n’aghughọ, si, Le, Geal nwa Ebed na umu-nne-ya nābà nime Shekem; ma, le, ha nākpab͕u obodo a imegide gi.

32 Ma ub͕u a, bilie n’abali, gi onwe-gi na ndi gi na ha nọ, ru kwa nbì n’ọhia:

33 ọ gēru kwa, n’ututu, mb͕e anyanwu nāwa, na i gēbili n’isi-ututu, made imegide obodo: ma, le, mb͕e ya onwe-ya na ndi ya na ha nọ nāpukute gi, i gēme kwa ha dika aka-gi gāchọta.

34 Abimelek we bilie n’abali, ya na ndi nile ndi soro ya, ha we rue nbì megide Shekem n’usu anọ.

35 Geal nwa Ebed we pua, guzo n’oghere ọnu-uzọ-ama obodo: Abimelek we si n’oruru-nbì ahu bilie, ya na ndi soro ya.

36 Geal we hu ndi ahu, we si Zebul, Le, ndi ufọdu si n’elu ugwu nārida. Zebul we si ya, Ọ bu onyinyo ugwu ka gi onwe-gi nāhu dika ndikom.

37 Geal we kwu ọzọ, si, Le, ndi ufọdu si n’elu-ala nke ala nārida, otù usu si kwa n’uzọ osisi terebinth nke Meonenim nābia.

38 Zebul we si ya, Òle ebe ọnu-gi ub͕u a, na i nāsi, Ònye bu Abimelek, na ayi gēfè ya òfùfè? Nkà abughi ndi nke i juworo? biko, pua ub͕u a, buso ha agha.

39 Geal we pua ga n’iru ndi-nwe Shekem, buso Abimelek agha.

40 Abimelek we chua ya, ọ we b͕alaga n’iru ya, ọtutu madu we da meru aru, rue oghere ọnu-uzọ-ama.

41 Abimelek we nọdu n’Aruma: Zebul we chupu Geal na umu-nne-ya, ka ha we ghara ibiri na Shekem.

42 O rue n’echi-ya, na ndi ahu puru ba n’ọhia; ha we gosi Abimelek.

43 O we chiri ndi-ya, kè ha usu atọ, rue nbì n’ọhia; ọ hu, ma, le, ndi ahu si n’obodo ahu nāputa; o we bilie imegide ha, tib͕ue ha.

44 Abimelek na usu ndi soro ya we made, guzo n’oghere ọnu-uzọ-ama obodo: usu abua ahu we made imegide ndi nile nọ n’ọhia, tib͕ue ha.

45 Abimelek we buso obodo ahu agha ubọchi ahu nile; o we were obodo ahu, b͕ue ndi nọ nime ya: ọ kwatue obodo ahu, ghasa ya nnú.

46 Ndi nile nwe ulo-elu Shekem we nu ya, ba n’ulo kachasi elu nke ulo El-berit.

47 Ewe gosi Abimelek na ndi nile nwe ulo-elu Shekem achikọtawo onwe-ha.

48 Abimelek we rigo n’ugwu Zalmon, ya onwe-ya na ndi nile soro ya; Abimelek we chiri anyu-ike-ha n’aka-ya, o we b͕utue alaka osisi, welie ya, tukwasi ya n’ubu-ya: ọ si ndi soro ya, Ihe unu huworom ka m’mere, menu ngwa, menu dika m’meworo.

49 Ndi ahu nile we b͕utu kwa, nwoke ọ bula alaka-ya, ha we jeso Abimelek, tukwasi ha n’ulo ahu kachasi elu, su ulo kachasi elu ahu ọku n’isi ha; ndikom nile nke ulo-elu Shekem we nwu kwa, bú ihe ra ka nnù ndikom na ndinyom abua na ọgu iri.

50 Abimelek we jerue Tibez, ma ulo-ikwū-ya megide Tibez, were ya.

51 Ma otù ulo-elu siri ike di n’etiti obodo ahu, ndikom nile na ndinyom nile na ndi nile nwe obodo ahu we b͕alaga n’ebe ahu, mechibido onwe-ha uzọ, rigo n’elu ulo-elu ahu.

52 Abimelek we biarue ulo-elu ahu, buso ya agha, jerue nso ọnu-uzọ ulo-elu ahu iwere ọku sure ya.

53 Otù nwayi we tua aka-nkume n’isi Abimelek, tuwa eju-isi-ya.

54 O we me ngwa kpọ nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, si ya, Miputa mma-agha-gi, me ka m’nwua, ka ha we ghara ikwu okwu bayerem, si, Nwayi b͕uru ya. Nwa-okorọbia-ya we mapue ya, ọ nwua.

55 Ndikom Israel we hu na Abimelek anwuruwo, ha we la, nwoke ọ bula n’ebe nke ya.

56 Chineke we nyeghachi ihe ọjọ Abimelek, nke o mere nna-ya, n’ib͕u ọgu umu-nne-ya atọ na iri:

57 ọ bu kwa ihe ọjọ nile nke ndikom Shekem ka Chineke nyeghachiri n’isi-ha: nkọcha Jotam nwa Jerubeal we biakwasi ha.

Categories
NDI-IKPE

NDI-IKPE 10

1 Mb͕e Abimelek nwusiri, Tola nwa Pua, nwa Dodo, bú onye Isaka, we bilie izọputa Israel; ya onwe-ya bi kwa na Shamia n’ugwu Efraim.

2 Ọ we kpe Israel ikpe orú arọ na atọ, we nwua, elìe ya na Shamia.

3 Mb͕e ọ nwusiri, Jaia, bú onye Gilead, we bilie; ọ kpe Israel ikpe orú arọ na abua.

4 Ọ nwe-kwa-ra orú umu-ndikom na iri ndi orú umu-inyinya-ibu na iri nēbu, ha nwe-kwa-ra orú obodo na iri, nke anākpọ Havot-jaia rue ta, nke di n’ala Gilead.

5 Jaia we nwua, elìe ya na Kamon.

6 Umu Israel we me kwa ihe ọjọ n’anya Jehova, fè Bealim, na Ashtarot, na chi nile nke Siria, na chi nile nke Zaidon, na chi nile nke Moab, na chi nile nke umu Amon, na chi nile nke ndi Filistia, òfùfè; ha we rapu Jehova, ha efèghi kwa Ya òfùfè.

7 Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we renye ha n’aka ndi Filistia, na n’aka umu Amon.

8 Ha we tipia, kpab͕u kwa umu Israel arọ ahu: arọ iri na asatọ ka ha kpab͕uru umu Israel nile ndi bi n’ofè Jọdan, n’ala ndi-Amorait, nke di na Gilead.

9 Umu Amon we gabiga Jọdan ibuso kwa Juda, na ibuso Benjamin, na ibuso ulo Efraim, agha; ewe kpab͕ue Israel nke-uku.

10 Umu Israel we tikue Jehova, si, Ayi emehiewo megide Gi, ọbuná n’ihi na ayi arapuwo Chineke-ayi, we fè Bealim òfùfè.

11 Jehova we si umu Israel, Àzọputaghm unu n’aka ndi Ijipt, na n’aka ndi-Amorait, na n’aka umu Amon, na n’aka ndi Filistia?

12 Ndi Zaidon kwa, na Amalek, na Maon, meb͕uru unu; unu we tikuem, M’we zọputa unu n’aka-ha.

13 Ma unu onwe-unu arapuwom, we fè chi ọzọ di iche iche òfùfè: n’ihi ya M’gaghi-azọputa kwa unu ọzọ.

14 Jenu, tikue chi ndi unu rọputaworo; ka ha onwe-ha zọputa unu na mb͕e nkpab͕u-unu.

15 Umu Israel we si Jehova, Ayi emehiewo: Gi onwe-gi me ayi dika ihe nile si di nke di nma n’anya-Gi; biko, nání naputa ayi ta.

16 Ha we si n’etiti ha wezuga chi ala ọzọ nile, fè Jehova òfùfè: nkpuru-obi-Ya enweghi kwa ntachi-obi n’ihi ọnọdu ọjọ nke Israel.

17 Umu Amon we kpọkọta onwe-ha, ma ulo-ikwū-ha na Gilead. Umu Israel we chikọta onwe-ha, ma ulo-ikwū-ha na Mizpa.

18 Ndi ahu, bú ndi-isi Gilead, we sirita onwe-ha, Ònye bu nwoke ahu nke gāmalite ibuso umu Amon agha? ọ gāghọrọ ndi nile bi na Gilead isi.