Categories
NDI-HIBRU

NDI-HIBRU 11

1 Ma okwukwe bu ndabere nke ihe anēle anya, buru kwa nnwaputa nke ihe anāhughi anya.

2 N’ihi na nime okwukwe ahu ka ab͕ara ndi okenye àmà.

3 Okwukwe ka ayi ji ghọta na ewerewo okwu Chineke dozie uwa nile, ya mere esiteghi n’ihe putaworo ìhè kpu ihe ahu anāhu anya.

4 Okwukwe ka Ebel ji che àjà n’iru Chineke nke ka àjà Kain chere nma, nke esitere na ya b͕ara ya àmà na ọ bu onye ezi omume, ebe Chineke b͕ara àmà bayere onyinye-ya nile: o site kwa na nke ahu nēkwu okwu ub͕u a, ọ bu ezie na ọ nwuru anwu.

5 Okwukwe ka eji būbiga Inok ka ọ ghara ihu ọnwu; ahughi kwa ya, n’ihi na Chineke bubigara ya-ri: n’ihi na mb͕e akēbubigaghi ya ab͕aworo ya àmà na ihe ọ nēmeri nātọ Chineke ezi utọ:

6 ma asi na okwukwe adighi ọ bu ihe anāpughi ime, bú ime ihe gātọ Chineke ezi utọ: n’ihi na onye nābiakute Chineke aghaghi ikwe na Ọ di, na Ọ nēgosi kwa Onwe-ya Onye nēnyeghachi ndi nāchọ Ya ugwọ-ọlu.

7 Noa, mb͕e Chineke dusiri ya ọdu bayere ihe akāhughi anya rue oge ahu, ebe ọ turu egwu Chineke, ọ bu okwukwe ka o ji dozie ub͕ọ izọputa èzí-na-ulo-Ya; o site-kwa-ra na nka ma uwa ikpé, we ghọ onye-nketa nke ezi omume ahu nke di n’uzọ okwukwe.

8 Mb͕e akpọrọ Abraham, okwukwe ka o ji ṅa nti ipu je ebe nke ọ gaje inara ka ọ buru ihe-nketa; o we pua, nāmaghi ebe ọ nēje.

9 Okwukwe ka o ji biri dika ọbìa n’ala nke ekwere ya-ri na nkwa, dika ala nābughi nke aka ya, ebe o biri n’ulo-ikwū, ya na Aisak na Jekob, ndi soro ya nēketakọ otù nkwa ahu:

10 n’ihi na ọ nēle anya obodo ahu nke nwere ntọ-ala ahu, nke Chineke bu onye-ọ̀kà-ya na onye luru ya.

11 Okwukwe ka Sera ji nara ike ọbuná imu nwa, ya onwe-ya, mb͕e ọ gasiri oge imu nwa, ebe ọ guru Ya n’Onye kwesiri ntukwasi-obi, bú Onye kwereri nkwa:

12 ọ bu kwa n’ihi nka ka esitere n’otù nwoke mu umu, mb͕e ọ di kwa ka onye nwuru anwu, bú umu bara uba dika kpakpando nke elu-igwe, di kwa ka ájá, nke di n’usọ oké osimiri, nke anāpughi iguta ọnu ya.

13 Ndia nile nwuru n’uzọ okwukwe, ebe ha anataghi nkwa ahu, kama ha huru ha-ri, si kwa n’ebe di anya kele ha, we kwuputa na ha bu ndi-ọbìa na ndi nọ dika ọbìa n’elu uwa.

14 N’ihi na ndi nēkwu ihe di otú a nēgosi na ha nāchọ ala nke gābu nke aka ha.

15 Ọ buru kwa na ọ bu ezie na ha nēcheta ala ahu nke ha si nime ya puta, ha gēnwewori oghere ilaghachi.

16 Ma otú ọ di ub͕u a ha nāb͕aso ala ka nma, nke ahu bu, ala di n’elu-igwe: n’ihi nka ihere ha adighi-eme Chineke, ka akpọ Ya Chineke-ha: n’ihi na O doziworo ha otù obodo.

17 Mb͕e anānwa Abraham, ọ bu okwukwe ka o ji che Aisak n’iru Chineke dika àjà: e, onye ahu nke narari nkwa ahu nke-ọma nēche nwa-nwoke ọ muru nání ya n’iru Chineke dika àjà:

18 bú onye ekwuru okwu bayere ya, si, Nime Aisak ka agākpọ nkpuru-gi:

19 ebe ọ nāgu na Chineke puru ime ka o si ọbuná na ndi nwuru anwu bilie; nke ọ naghachi-kwa-ra ya site n’ebe ahu nime ilu.

20 Okwukwe ka Aisak ji gọzie Jekob na Isọ, ọbuná ngọzi bayere ihe gaje ibia.

21 Mb͕e Jekob nānwu anwu, ọ bu okwukwe ka o ji gọzie umu-ndikom Josef n’otù n’otù; kpọ kwa isi ala nye Chineke, nādabere n’isi nkpa-n’aka-ya.

22 Mb͕e ndu Josef nāgwu, ọ bu okwukwe ka o ji kwue, ihe bayere ọpupu nke umu Israel; nye kwa iwu bayere ọkpukpu-ya.

23 Mb͕e amuru Moses, ọ bu okwukwe ka ndi muru ya ji zobe ya ọnwa atọ, n’ihi na ha huru na nwatakiri ahu mara nma; ha atughi kwa egwu ihe eze ala ahu nyere n’iwu.

24 Mb͕e Moses toruru madu, ọ bu okwukwe ka o ji ju ka akpọ ya nwa-nwoke nke nwa-nwanyi Fero;

25 n’ihi na ọ chọrọ ka emejọkọ ya na ndi nke Chineke, kama inwe ihe-utọ nke nmehie na nwa oge;

26 ebe ọ guru ita-uta nke Kraist-ayi n’àkù dikariri àkù nile nke Ijipt uku: n’ihi na ọ wepuru anya-ya le nnyeghachi nke ugwọ-ọlu ahu.

27 Okwukwe ka o ji rapu Ijipt, n’ihi na ọ tughi egwu ọnuma nke eze ahu: n’ihi na ọ nọgidesiri ike, dika ọ nāhu Onye ahu Nke anāpughi ihu Ya anya.

28 Okwukwe ka o ji me ememe ngabiga ahu, ya na nwusa ọbara ahu, ka onye ahu nēbibi umu eburu uzọ mu we ghara imetu ha aka.

29 Okwukwe ka ha ji gabiga n’etiti oké osimiri Uhie dika ọ bu ala kpọrọ nku: ma elomiri ndi Ijipt mb͕e ha nwara igabiga ya.

30 Okwukwe ka mb͕idi nke Jeriko ji da, mb͕e agasiri ha gburugburu ubọchi asa.

31 Okwukwe ka Rehab, bú nwanyi nākwa iko, ji ghara iso ndi nēkweyeghi ekweye lakọ n’iyi, ebe o were udo nata ndi ledoro obodo ahu anya.

32 Gini ka m’gēkwu kwa ọzọ? n’ihi na oge gāgwunarim ma ọ buru na akọm akukọ bayere Gideon, Berak, Samson, Jefta; ha na Devid na Samuel na ndi-amuma:

33 ndi sitere n’okwukwe lub͕u ala-eze, lu ọlu ezi omume, nata nkwa di iche iche, kpuchita ọnu ọdum,

34 menyu ike ọku, b͕anari iru mma-agha, ndi esitere n’okwukwe me ka ha di ike site n’adighi-ike, me ka ha di ike n’agha, ndi sitere n’okwukwe chulaga usu-ndi-agha nke ndi ala ọzọ.

35 Ndinyom natara ndi-ha ndi nwuru anwu site na nbilite-n’ọnwu: ma etib͕uru ndi ọzọ, ebe ha juru inata nb͕aputa-ha; ka ha we nata nbilite-n’ọnwu ka nma:

36 ma ndi ọzọ ka anwara ọnwunwa nke ihe-ọchi na utari, e, tukwasi ihe ndia, nke ab͕u na ulo-nkpọrọ:

37 aturu ha nkume, akwọwara ha, anwara ha, ewere iru mma-agha b͕ue ha: ha yiri akpukpọ aturu na akpukpọ ewu nējeghari; ebe ha nọ na nkpà, anākpab͕u ha, anēmejọ ha

38 (ndi uwa nēkwesigh), nāwaghari n’ọhia na ugwu na ọb͕à na ọnu nke ala.

39 Ndia nile, ọ bu ezie na ab͕ara ha àmà site n’okwukwe-ha, ma ha anataghi nkwà ahu,

40 n’ihi na Chineke buru uzọ leputa ihe ka nma bayere ayi, ka aghara ime ka ha zue okè ma asi na ayi anọghi ya.

Categories
NDI-HIBRU

NDI-HIBRU 12

1 Ya mere ka ayi onwe-ayi, ebe ayi nwere oké ìgwè ndi-àmà di otú a ndi b͕ara ayi gburugburu dika igwe-oji, ka ayi tupu kwa ibu nile ọ bula, ya na nmehie ahu nke nārapara ayi n’aru nke-uku, ka ayi were kwa ntachi-obi b͕a ọsọ ahu edebere ayi n’iru,

2 nēlegide Jisus anya, bú onye-ndú na onye-nmezu nke okwukwe-ayi, Onye n’ihi ọṅù edebere n’iru Ya nātachi obi n’obe-Ya, nēlelì ihere anya, O we nọdu n’aka-nri nke oche-eze Chineke.

3 na n’ihi ya, tugharianu uche n’Onye ahu Nke tachiworo obi na nkwugide di otú a, bú nke ndi-nmehie nēkwugide onwe-ha, ka ike ghara igwu unu, unu we da #mbà na nkpuru-obi-unu.

4 Unu akēguzogideghi rue ọbara, n’ib͕a nb͕a megide nmehie:

5 unu echezọsiwo kwa okwu nkasi-obi ahu, nke nāgwa unu okwu dika anāgwa umu-ndikom, si,

Nwam, agula ya n’ihe ntà, bú ozizí Onye-nwe-ayi nēzí gi site n’inye gi ahuhu,

Ada-kwa-la #mbà mb͕e Ọ nātu gi nmehie-gi n’anya;

6 N’ihi na onye Onye-nwe-ayi huru n’anya ka Ọ nēzí ihe site n’inye ya ahuhu,

O nāpia kwa nwa ọ bula Ọ nānata utari.

7 Nātachinu obi ka ewe zí unu ihe site n’inye unu ahuhu; n’ihi na Chineke nēmeso unu dika umu; n’ihi na ònye bu nwa ahu nna-ya nādighi-ezi ya ihe site n’inye ya ahuhu?

8 Ma ọ buru na adighi-ezí unu ihe site n’inye unu ahuhu, nke emeworo unu niile ka ha buru ndi-nketa, ya mere unu bu umu iko, unu abughi kwa umu n’ezie.

9 Ọzọ kwa, ayi nwere ndi bu nna nke anu-aru-ayi izí ayi ihe site n’inye ayi ahuhu, ayi we sọpuru ha: àyi agaghi-edo kari onwe-ayi nke-uku n’okpuru Nna nke mọ-ayi, we di ndu?

10 N’ihi na ndi ahu nezí ayi ihe site n’inye ayi ahuhu n’ezie ubọchi ole-na-ole otú ọ di ha nma; ma Ya onwe-ya nēzí ayi ihe site n’inye ayi ahuhu ka o we bara ayi urù, ka ayi we keta idi-nsọ-Ya.

11 Ozizí nile site n’inye ahuhu nādi ka ihe nādighi-eweta ọṅù n’oge di ub͕u a, kama nwuta: ma emesia ọ nēnyeghachi ndi ahu ewereworo ya nwaputa ha nkpuru nke di n’udo, bú nkpuru nke ezi omume.

12 N’ihi nka menu aka nēruda eruda na ikperè nwuworo anwu ka ha guzozie:

13 kwa-kwa-ranu ukwu-unu uzọ nke nēguzozi ọtọ, ka ewe ghara ime ka ukwu nke di ngwurọ kwopu, kama ka ewe me ka ọ di ike.

14 Nāb͕asonu udo n’ebe madu nile nọ, ya na ido-nsọ ahu, nke onye ọ bula agaghi-ahu Onye-nwe-ayi anya ma o nweghi ya:

15 nēle-kwa-nu anya nke-ọma, ma ọ di onye ọ bula nke nērughi amara Chineke; ka nkpọrọgwụ ilu obula we ghara ipuputa we sob͕ue unu; ewe were nkpọrọgwụ ahu meru ọra madu;

16 ma ọ di onye ọ bula nke nākwa iko, ma-ọbu nke emeruru emeru, dika Isọ, onye rere di-ọkpara ya onwe-ya bu n’ọnọdu otù oriri.

17 N’ihi na unu matara na ọbuná mb͕e ọ chọrọ iketa ngọzi ahu mb͕e emesiri, ajuru ya (n’ihi na ọ hughi ọnọdu nke nchèghari), ọ bu ezie na o were anya-miri chọsie ya ike.

18 N’ihi na unu abiarughi ọku nke apuru idatu ya aka na nke afunwuworo, na itiri, na ọchichiri, na oké ifufe,

19 na udà opì, na olu okwu; nke ndi nuru ya riọrọ ka aghara itukwasiri ha okwu ọ bula ọzọ:

20 n’ihi na ha anānagideghi ihe enyere n’iwu, bú, Asi na ọbuná anu-ulo emetu ugwu ahu, agēwere nkume tub͕ue ya;

21 ka ihe ahu anēkiri si di kwa egwu nke-uku, Moses siri, Anamatu oké egwu, aru ma-kwa-ram jijiji:

22 kama unu abiaruwo ugwu Zaion, na obodo nke Chineke di ndu, bú Jerusalem nke di n’elu-igwe, na ọtutu ndi anāpughi iguta ọnu,

23 bú nb͕akọ ọra ndi-mọ-ozi nile, na nzukọ nke ndi eburu uzọ muputa ndi edeworo aha-ha n’akwukwọ n’elu-igwe, na Chineke, bú Onye-ikpé ọra madu, na mọ nke ndi ezi omume emeworo ka ha zue okè,

24 na Jisus, bú onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ọhu, na ọbara nke nfesa nke nēkwu nke-ọma kari nke ọbara Ebel kwuru.

25 Lezienu anya ka unu ghara iju Onye ahu nēkwu okwu. N’ihi na asi na ndi ahu ab͕anarighi Ya, mb͕e ha juru Onye ahu Nke nādu ha ọdú n’elu uwa, ayi onwe-ayi agaghi-ab͕anari Ya kari nke-uku, bú ndi nāb͕akuta Onye ahu azu Nke nādu ọdú site n’elu-igwe:

26 Onye olu-Ya mere uwa ka o me nkpatu mb͕e ahu: ma ub͕u a ka O kweworo nkwa, si, Nání otù mb͕e ọzọ fọduru nke Mu onwem gēji me ka ọ bughi nání uwa ma jijiji, kama elu-igwe kwa.

27 Ma okwu nka, Nání otù mb͕e ọzọ fọduru, nēgosi nbubiga nke ihe ahu nke anēme ka ha me nkpatu, dika nke ihe emeworo, ka ihe ahu nke anēmeghi ka ha me nkpatu we digide.

28 N’ihi nka, ebe ayi nānata ala-eze nke anāpughi ime ka o me nkpatu, ka ayi nwe amara, ka ayi we site na ya were egwu Chineke na ujọ kpe ekpere n’uzọ nke gātọ Chineke utọ:

29 n’ihi na Chineke-ayi bu ọku nērechapu.

Categories
NDI-HIBRU

NDI-HIBRU 13

1 Ka ihu-n’anya-unu n’ebe umu-nna-unu nọ nādigide.

2 Unu echezọla ile ndi-ọbìa nke-ọma: n’ihi na ufọdu esitewo na nka le ndi-mọ-ozi ọbìa nāmaghi ama.

3 Nēchetanu ndi nọ n’ab͕u, dika ndi ekekọworo unu na ha n’ab͕u; nēchetanu ndi anēmejọ, dika ndi unu onwe-unu nọ kwa n’aru.

4 Ka ilu-di-na-nwunye buru ihe anāsọpuru n’etiti unu nile, ka ihe-ndina-unu buru kwa ihe adighi-emeru emeru: n’ihi na Chineke gēkpe ndi nākwa iko ikpé, ha na ndi nākwa iko, bú ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di.

5 Ka ọchichọ-obi-unu ghara idi n’ihu-n’anya ego; ka afọ ju unu n’ihe unu nwere ub͕u a: n’ihi na Ya onwe-ya ekwuwo, si, M’gaghi-ara gi aka ma-ọli, M’gaghi-arapu kwa gi ma-ọli.

6 Ya mere ayi were obi-ike si,

Onye-nwe-ayi bu onye nēyerem aka;

Gini ka madu gēmem?

7 Nēchetanu ndi-isi-unu, bú madu ndi gwara unu okwu Chineke; nēkiri-kwa-nu ọpupu nke ibi-obi-ha, nēṅomi-kwa-nu okwukwe-ha.

8 Jisus Kraist di otù aka ahu nnyahu na ta, ma rukwa mb͕e nile ebighi-ebi.

9 Unu ekwela ka ewere ozizí di iche iche nke si kwa n’ebe ọzọ puta duhie unu: n’ihi na ọ di nma ka ewere amara me ka obi-unu guzosie ike; ka aghara iwere ihe-oriri, nke ọ dighi mb͕e ha bara ndi jeghariri nime ha urù.

10 Ayi nwere ebe-ichu-àjà, nke ndi nēkpe ekpere n’ulo-ikwū Chineke nēnweghi ike iri ihe si nime ya puta.

11 N’ihi na ozu anu nile nke anēwebata ọbara-ha n’ebe nsọ site n’aka onye-isi-nchu-àjà dika àjà achuru bayere nmehie, anērechapu ozu ahu ọku n’azu ọmuma-ulo-ikwū.

12 N’ihi nka Jisus, ka O we site n’ọbara nke Ya onwe-ya do ndi nke Ya nsọ, Ọ hu-kwa-ra ahuhu n’azu ọnu-uzọ-ama nke obodo.

13 Ya mere, ka ayi pukuru Ya n’azu ọmuma-ulo-ikwū, nēbu ita-uta-Ya.

14 N’ihi na ayi enweghi obodo n’ebe a nke nādigide, kama ayi nāchọ obodo ahu nke gaje ibia.

15 Ya mere, ka ayi site n’aka-Ya nāchu àjà, bú otuto, nye Chineke mb͕e nile, nke ahu bu, nkpuru eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuputa nye aha-Ya.

16 Ma unu echezọla ime ihe di nma na ime ka unu na ndi ọzọ nwekọ ihe-unu: n’ihi na àjà di otú a nātọ Chineke ezi utọ.

17 Nēkweyenu ndi-isi-unu, nēdo-kwa-nu onwe-unu n’okpuru ha: n’ihi na ndi ahu nāmu anya n’ihi nkpuru-obi-unu, dika ndi gāza ajuju bayere unu: ka ha we were ọṅù me nka, ghara isu udè: n’ihi na nka gābu ihe nābaghi unu urù.

18 Nēkpenu ekpere bayere ayi: n’ihi na emere ka ayi kweye na ayi nwere akọ-na-uche ọma, ebe ayi nāchọ ibi obi nke-ọma n’ihe nile.

19 Ma anamariọbiga unu ókè kari ime nka, ka ewe werem nyeghachi unu ọsọsọ kari.

20 Ma Chineke nke udo, Onye were ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ahu si na ndi nwuru anwu kughachi oké Onye-ọzùzù-aturu nke aturu-Ya, bú Onye- nwe-ayi Jisus,

21 Ya me ka unu zue okè n’ezi ihe nile ọ bula ime ihe Ọ nāchọ, nēme nime ayi ihe nātọ ezi utọ n’iru Ya, site n’aka Jisus Kraist; Onye otuto nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

22 Ma ariọm unu, umu-nnam, nānagidenu okwu aririọ a: n’ihi na anamewere okwu ole-na-ole degara unu akwukwọ-ozi.

23 Maranu na arapuwo nwa-nna-ayi Timọti ka ọ la; ọ buru kwa na ọ gābia na mb͕e ntà, mu na Ya gāhu unu anya.

24 Kelenu ndi-isi-unu nile na ndi nsọ nile. Ndi Itali nēkele unu.

25 Ka amara diyere unu nile. Amen.