Categories
NDI-HIBRU

NDI-HIBRU 1

1 Chineke, mb͕e Ọ gwarari nna-ayi-hà okwu n’oge ochie nime ndi-amuma n’iberibe-akwukwọ di iche iche na uzọ di iche iche,

2 Ọ gwara ayi okwu n’ọgwugwu ubọchi ndia nime Ọkpara, Onye O doro onye-nketa nke ihe nile, Onye O site-kwa-ra n’aka-Ya me uwa nile;

3 Onye, ebe Ọ bu nnwupu nke ebube-Ya na onyinyo nke udi-Ya, ebe O nēbu kwa ihe nile site n’okwu nke ike-Ya, mb͕e Ọ sachasiri nmehie nile ayi, O we nọdu n’aka-nri nke Idi-uku ahu di n’elu;

4 ebe emere Ya-ri ka Ọ ka ndi-mọ-ozi nma n’uzọ ra otú O ketawa aha nke ka nma.

5 N’ihi na ọ̀ bu onye n’etiti ndi-mọ-ozi ka Ọ siri mb͕e ọ bula,

Ọkparam ka Gi onwe-gi bu,

Mu onwem amuwo Gi ta?

ọzọ kwa,

Mu onwem gāburu Ya Nna,

Ya onwe-ya gābu-kwa-ram Ọkpara?

6 Ma ọzọ kwa, mb͕e ọ bula Ọ gākpọbatawori Ọkpara ahu n’elu-uwa ebe madu bi, Ọ si, Ka ndi-mọ-ozi nile nke Chineke kpọ kwa isi ala nye Ya.

7 Ọ nēkwu kwa ihe bayere ndi-mọ-ozi, si,

Onye nēme ndi-mọ-ozi-Ya ka ha buru ifufe,

Nēme kwa ndi nējere Ya ozi ka ha buru ọku nēnwu enwu:

8 ma Ọ nēkwu ihe bayere Ọkpara ahu, si,

Oche-eze-gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi;

Nkpa-n’aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n’aka nke ala-eze-Gi bu kwa.

9 I huru ezi omume n’anya, we kpọ nmebi-iwu asì;

N’ihi nka Chineke, bú Chineke-Gi, tere Gi

Manu obi-utọ n’isi kari ndi-nketa-ibe-Gi.

10 Ọzọ kwa,

Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, na mbu ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa;

Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa:

11 Ha onwe-ha gāla n’iyì; ma Gi onwe-gi nānọgide:

Ha nile gāka kwa nká dika uwe;

12 Dika ákwà-nb͕okwasi ka I gāpiakọta kwa ha,

Dika uwe, agāb͕anwe kwa ha:

Ma Gi onwe-gi bu Onye ahu Nke nādi mb͕e nile,

Arọ-Gi nile agaghi-agwu kwa agwu.

13 Ma ọ̀ bu onye n’etiti ndi-mọ-ozi ka O kwuworo okwu bayere ya mb͕e ọ bula, si,

Nọdu ala n’aka-nrim,

Rue mb͕e M’gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi ukwu-Gi abua?

14 Hà nile abughi ndi-mọ nēfè òfùfè, ndi eziputara ije ozi n’ihi ndi gaje iketa nzọputa?

Categories
NDI-HIBRU

NDI-HIBRU 2

1 N’ihi nka ayi aghaghi iṅabiga nti ókè kari n’ihe anuru, ka aghara ibupu ayi n’ebe ha di ma eleghi anya, dika miri nēbupu ub͕ọ.

2 N’ihi na asi na emere okwu ekwuru site n’ọnu ndi-mọ-ozi ka o guzosie ike, asi kwa na njehie nile ọ bula na aṅaghi-nti nile ọ bula natara nnyeghachi nke ugwọ-ọlu ziri ezi;

3 àyi onwe-ayi gēsi aṅa b͕anari, ma ọ buru na ayi leghara oké nzọputa di otú a anya? bú nzọputa nke eburu uzọ kwu site n’ọnu Onye-nwe-ayi, ndi nuru ya we me ka o guzosie ike rue ebe ayi nọ;

4 Chineke nēso kwa ha nāb͕akọ àmà, site n’ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche, site kwa n’ọlu ike di iche iche, site kwa n’òkìkè nke Mọ Nsọ, dika ọchichọ nke aka Ya si di.

5 N’ihi na ọ bughi n’okpuru ndi-mọ-ozi ka O doro elu-uwa dum madu bi nke gaje ibia, bú nke ayi nēkwu okwu bayere ya.

6 Ma otù onye kwusiri ike n’otù ebe, si,

Gini ka madu bu, na I nēcheta ya?

Ma-ọbu nwa nke madu, na I nēleta ya?

7 I mere ya ka ọ di kari ndi-mọ-ozi ala nke-ntà;

I ji ebube na nsọpuru kpube ya n’isi dika okpu-eze,

I do-kwa-ra ya onye-isi ọlu nile nke aka-Gi abua:

8 Ihe nile ka I doro n’okpuru ukwu-ya abua.

N’ihi na na n’ido, ihe nile ahu n’okpuru ya, ọ dighi ihe ọ bula Ọ rapuru nke anēdoghi n’okpuru ya. Ma ub͕u a ayi akāhughi ihe nile ahu na edowo ha n’okpuru ya.

9 Ma Onye ahu Nke emere Ya ka ọ di kari ndi-mọ-ozi ala nke-ntà, bú Jisus, Ya ka ayi nēle anya, na ejiwo ebube na nsọpuru kpube Ya n’isi dika okpu-eze n’ihi ahuhu nke ọnwu, ka O we site n’amara Chineke detu ọnwu ire n’ihi madu nile ọ bula.

10 N’ihi na o kwesiri Ya, bú Onye ihe nile di n’ihi Ya, Onye ihe nile site-kwa-ra n’aka-Ya di, ebe O kubatarari ọtutu umu-ndikom n’ebube, ka O site n’ahuhu me ka Onye nēdubà ha na nzọputa-ha zue okè.

11 N’ihi na ma Onye nēdo ha nsọ ma ndi anēdo nsọ, ha nile sitere n’otù Nna: ọ bu kwa n’ihi ihe a ka ihere ikpọ ha umu-nna-Ya adighi-eme Ya,

12 Ọ si,

Agamakọrọ umu-nnem aha-Gi,

N’etiti nzukọ-Gi k m’gābù abu nye Gi.

13 Ọzọ kwa, Mu onwem ganātukwasi obim na Ya. Ọzọ kwa, Le, Mu onwem na umu-ntakiri Chineke nyerem.

14 Ya mere ebe umu-ntakiri ahu bu ndi nēnwekọ anu-aru na ọbara, Ya onwe-ya n’otù uzọ ahu keta-kwa-ra ihe ndia; ka O we site n’ọnwu me ka onye ahu ghara idi irè, bú onye nwere ike nke ọnwu, ya bu ekwensu;

15 ka O we site kwa n’ọnwu naputa ndi ahu, ka ha ra, bú ndi ewere egwu ọnwu tinye n’ibu-orù n’ogologo ndù-ha nile.

16 N’ihi na ọ bu ihe amara nke-ọma na ọ bughi ndi-mọ-ozi ka Ọ nējide aka, kama Ọ nējide nkpuru Abraham aka.

17 O sitere na ya ji ugwọ ka eme ka O yie umu-nna-Ya n’ihe nile, ka O we ghọ onye-isi-nchu-àjà di ebere, Onye kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi, n’ihe nile diri Chineke, ka O we me ka obi Chineke juru n’ebe nmehie nile nke ndi nke Ya di.

18 N’ihi na ebe Ya onwe-ya huworo ahuhu site n’ọnwunwa anwara Ya, Ọ puru iyere ndi anānwa aka.

Categories
NDI-HIBRU

NDI-HIBRU 3

1 Ya mere, umu-nnam di nsọ, ndi nketa nke ọkpukpọ nke elu-igwe, tugharinu uche n’Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà nke nkwuputa-ayi, bú Jisus;

2 na ọbu onye kwesiri ntukwasi-obi n’ebe Onye ahu nọ, bú Onye mere Ya ka Ọ buru Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà, dika Moses di kwa n’èzi-na-ulo-Ya dum.

3 N’ihi na aguwo Onye a n’Onye kwesiri otuto kari Moses, n’uzọ na otú ahu onye luru èzi-na-ulo nwere nsọpuru kari èzi-na-ulo-ya.

4 N’ihi na èzi-na-ulo ọ bula nwere onye luru ya; ma Onye luru ihe nile bu Chineke.

5 Ọ bu kwa ezie na Moses kwesiri ntukwasi-obi n’èzi-na-ulo-Ya dum dika onye nēje ozi, ka ọ buru ihe-àmà nke ihe nile agaje ikwu;

6 ma Kraist kwesiri ntukwasi-obi dika Ọkpara, Nke bu onye-isi n’èzi-na-ulo-Ya; Onye ayi onwe-ayi bu èzi-na-ulo-Ya, ma ọ buru na ayi jidesie nkwuwa-okwu-ayi na inya-isi nke olile-anya-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile.

7 N’ihi nka, dika Mọ Nsọ nāsi,

Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya,

8 Unu emela ka obi-unu sie ike, dika n’ikpasu-obi-ilu ahu,

Dika emere n’ubọchi ọnwunwa ahu n’ọhia,

9 Ebe nna-unu-hà nwaram na nnwaputa ikem,

Hu kwa ọlum ọgu arọ abua.

10 N’ihi nka ọnuma dim n’obi megide ọb͕ọ a,

M’we si, Ha nējehie mb͕e nile n’obi-ha:

Ma ndi ahu amaghi uzọm nile;

11 Dika M’ṅuru iyí n’iwe m si,

Ha agaghi-abà n’izu-ikem ma-ọli.

12 Lezienu anya, umu-nnam, ka ajọ obi nke ekweghi-ekwe ghara idi nime onye ọ bula n’etiti unu ma eleghi anya, n’iwezuga onwe-ya n’ebe Chineke di ndu nọ:

13 kama nāriọritanu ibe-unu aririọ kwa-ubọchi, n’ogologo oge a anākpọ ya Ta; ka obi onye ọ bula n’etiti unu ghara ime etili site n’aghughọ nke nmehie:

14 n’ihi na ayi aghọwo ndi nketa nke Kraist, ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi jidesiri nmalite nke ndabere-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile:

15 n’oge anēkwu, si,

Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya,

Unu emela ka obi-unu sie ike, dika n’ikpasu-obi-ilu ahu.

16 N’ihi na òle ndi, mb͕e ha nuru, kpasuru obi-ilu? ọ̀ bughi kwa ndi nile ndi siri n’Ijipt puta site n’aka Moses?

17 Ma òle ndi ka ọnuma di Ya n’obi megide ọgu arọ abua? ọ̀ bughi ndi mehiere, ndi ozu-ha dara nime ọhia?

18 Ma òle ndi ka Ọ ṅuru iyi na ha agaghi-abà n’izu-ike-Ya, ma ọ bughi ndi nēkweyeghi?

19 Ayi riba-kwa-ra ama na ha apughi ibà nime n’ihi ekweghi-ekwe.

Categories
NDI-HIBRU

NDI-HIBRU 4

1 Ya mere ka ayi tua egwui ma, ebe nkwa ibà n’izu-ike-Ya fọduru, ọ di onye ọ bula n’etiti unu ọ gādi ka o rughi ya ma eleghi anya.

2 N’ihi na eziwo kwa ayi ozi ọma, ọbuná dika ezi-kwa-ra ha: ma okwu nke ha nuru abaraghi ha urù, n’ihi na ejighi okwukwe tunyere ha na ndi nuru n’ezie.

3 N’ihi na ayi, bú ndi kwere ekwe, nābà n’izu-ike ahu; dika O kwuworo, si,

Dika M’ṅuru iyi n’iwem,

Ha agaghi-abà n’izu-ikem ma-ọli:

ọ bu ezie na alusiri ọlu nile site na ntọ-ala nke uwa.

4 N’ihi na O kwuwo n’otù ebe okwu bayere ubọchi nke-asa otú a, si, Chineke we zuru ike n’ubọchi nke-asa n’ọlu-Ya nile;

5 ọzọ, Ọ si kwa n’ebe a,

Ha agaghi-abà n’izu-ikem ma-ọli.

6 Ya mere ebe ọ foduru ka ufọdu ba nime ya, ndi eburu uzọ zie ozi ọma abàghi kwa nime ya n’ihi ekweyeghi-ekwenye,

7 O we kà otù ubọchi ọzọ, nēkwu nime Devid, mb͕e ogologo oge di otú a gasiri, si, Ta, dika ebuworo uzọ kwue, si,

Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya,

Unu emela ka obi-unu sie ike.

8 N’ihi na asi na Joshua mereri ka ha zuru ike, Ọ gaghi-adi nēkwu okwu bayere ubọchi ọzọ mb͕e ihe ndia gasiri.

9 Ya mere idebe-ubọchi-izu-ike fọduru ndi nke Chineke.

10 N’ihi na onye bataworo n’izu-ike-ya, ya onwe-ya ezuwo kwa ike n’ọlu-ya nile, dika Chineke zuru ike n’ọlu nke aka Ya.

11 Ya mere ka ayi nānu ọku n’obi ibà n’izu-ike ahu, ka onye ọ bula ghara ida n’otù ihe-nṅomi ahu nke ekweyeghi-ekweye.

12 N’ihi na okwu Chineke di ndu, nālusi kwa ọlu ike, di kwa nkọ kari mma-agha ọ bula nke nwere iru abua, nādu kwa rue n’ikewa nkpuru-obi na mọ, ma njikọta ma umi, buru kwa ihe nwere ike ituputa èchichè na izù nile nke obi.

13 Ọ dighi kwa ihe ekère èkè nke nāputaghi ihè n’iru Ya: kama ihe nile b͕a ọtọ buru kwa ihe emegheworo n’anya-Ya, bú Onye ayi gākọrọ akukọ bayere omume-ayi.

14 Ya mere ebe ayi nwere Onye-isi-nchu-àjà di uku, Onye gabigaworo eluigwe nile, bú Jisus Ọkpara Chineke, ka ayi jidesie nkwuputa-ayi ike.

15 N’ihi na ayi enweghi onye-isi-nchu-àjà onye nāpughi iji obi so ayi hukọ ahuhu n’adighi-ike-ayi; kama ayi nwere Onye anwaworo n’ihe nile n’otù uzọ ahu anānwa ayi, ma O mehieghi.

16 Ya mere ka ayi were nkwuwa-okwu biarue oche-eze amara, ka ewe mere ayi ebere, ka ayi we hu kwa amara iyere ayi aka n’oge nkpà.

Categories
NDI-HIBRU

NDI-HIBRU 5

1 N’ihi na onye-isi-nchu-àjà ọ bula, esi n’etiti madu weputa ya, ọ bu n’ihi madu ka anēdo ya onye-isi-nchu-àjà n’ihe diri Chineke, ka o we nēche onyinye na àjà di iche iche n’ihi nmehie n’iru Chineke:

2 ọ bu kwa onye puru iwere nwayọ nēmeso ndi nāmaghi ihe ndi nējehie kwa ejehie, n’ihi na adighi-ike di kwa ya onwe-ya gburugburu;

3 n’ihi nka o ji kwa ugwọ iche àjà n’iru Chineke n’ihi nmehie, dika ọ nēchere ndi Israel, otú ahu ọ nēche-kwa-ra onwe-ya.

4 Ọ dighi kwa onye ọ bula nānara nsọpuru a n’onwe-ya, kama mb͕e Chineke nākpọ ya, ọbuná dika Ọ kpọ-kwa-ra Eron.

5 Otú a Kraist enyeghi kwa Onwe-ya otuto ka ewe me Ya onye-isi-nchu-àjà, kama ọ bu Onye siri Ya,

Ọkparam ka Gi onwe-gi bu,

Mu onwem amuwo Gi ta:

6 dika O si kwu kwa n’ebe di iche, si,

Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi

Dika usoro Melkizedek si di.

7 Onye n’ubọchi nke anu-aru-Ya, mb͕e Ọ weresiri ikwa-ákwá siri ike na anya-miri che ekpere na aririọ n’iru Onye ahu puru izọputa Ya n’ọnwu, mb͕e anusi-kwa-ra olu-Ya n’ihi na Ọ turu egwu Chineke,

8 ọ bu ezie na Ọ bu Ọkpara, ma Ọ mutara iṅa-nti-Ya site n’ahuhu nile Ọ huru;

9 ebe emesiri Ya ka O zue okè, O we ghọrọ ndi nile nāṅa Ya nti Onye nēwetara ha nzọputa ebighi-ebi;

10 Onye Chineke nyere aha onye-isi-nchu-àjà dika usoro Melkizedek si di.

11 Onye okwu ayi nwere ikwu bayere ya di uku, di kwa ike isughari asusu, ebe unu ghọworo ndi nwere nti ike.

12 N’ihi na mb͕e unu kwesiri ibu ndi-ozizí n’ihi oge, ọ di unu nkpà ọzọ ka madu zí unu ihe bu ihe-ozizí mbu nke nmalite okwu si n’ọnu Chineke puta; unu aghọwo kwa ndi miri-ara di nkpà, ọ bughi nri siri ike.

13 N’ihi na onye ọ bula nke nēketa miri-ara bu onye akānwaghi ya n’okwu ezi omume; n’ihi na ọ bu nwa ọhu.

14 Ma nri siri ike bu nke ndi tozuru okè, ndi anwaworo nghọta-ha n’ihi omume ha nēme mb͕e dum itule ihe ọma na ihe ọjọ.

Categories
NDI-HIBRU

NDI-HIBRU 6

1 N’ihi nka ka ayi rapu okwu nke nmalite nke Kraist, ka anēburu kwa ayi rue n’itozu-okè; ka ayi ghara itọ ntọ-ala ọzọ nke bu nchèghari iji pua n’ọlu nile nwuru anwu, na okwukwe ekwere na Chineke,

2 ozizí nke ime-baptism, na nke ibikwasi-aka-n’isi, na nke nbilite-n’ọnwu nke ndi nwuru anwu, na nke ikpé ebighi-ebi.

3 Nka ka ayi gēme kwa, ma ọ buru na Chineke kwe.

4 N’ihi na ndi enyere ìhè otù mb͕e, ndi detu-kwa-ra onyinye elu-igwe ahu ire, ndi eme-kwa-ra ka ha keta Mọ Nsọ,

5 ndi detu-kwa-ra okwu Chineke ire hu ọ di nma, detu kwa ike nile nke oge gaje ibia ire,

6 ha we dahie, ọ bu ihe anāpughi ime bu ime ka ha buru ndi ọhu ọzọ ichèghari echèghari; ebe ha nākpọgidere onwe-ha Ọkpara Chineke n’obe ọzọ, debe kwa Ya n’ọnọdu-ihere n’iru ọra madu.

7 N’ihi na ala nke ṅuworo miri-ozuzo nke nēzokwasi ya ọtutu mb͕e, nke nēpuputa kwa nkpa-akwukwọ kwesiri ndi ahu, bú ndi anālu kwa ya ọlu n’ihi ha, ala ahu nēkère ngọzi si n’aka Chineke bia:

8 ma ọ buru na ọ nēweputa ogwu na uke, ọ bu ihe ajuru aju, di kwa ọbubu-ọnu nso; nke ọgwugwu-ya bu ire ya ọku.

9 Ma, ndi m’huru n’anya, emewo ka ayi kwere ihe ka nma bayere unu, bú ihe nke ha na nzọputa yikọ kwa, ọ bu ezie na ayi nēkwu otú a:

10 n’ihi na Chineke abughi onye ajọ omume ichezọ ọlu-unu na ihu-n’anya ahu unu gosiri n’ebe aha-Ya di, ebe unu jere ndi nsọ ozi, nēje-kwa-ra ha ozi.

11 Ma ọ nāgu ayi agu ka unu nile n’otù n’otù we nēgosi otù inu-ọku-n’obi ahu ka unu we nwezue olile-anya-ayi rue ọgwugwu ihe nile:

12 ka unu we ghara ighọ ndi ume-ngwu, kama ka unu we buru ndi nēṅomi ndi ahu ndi ji okwukwe na ogologo-ntachi-obi nēketa nkwa ahu.

13 N’ihi na mb͕e Chineke kwere Abraham nkwa, ebe Ọ nēnweghi onye ọ bula ka Ya uku iji ṅu iyí, O ji Onwe-ya ṅu iyí,

14 si, Me-elu-me-ala n’igọzi M’gāgọzi gi, n’ime ka aba uba M’gēme ka i ba uba.

15 Otú a o we nwe ogologo-ntachi-obi, we nata kwa nkwa ahu.

16 N’ihi na madu ji onye ka ha uku aṅu iyi: iṅu-iyi bu-kwa-ra ha nkwubì-okwu nke okwu ọ bula, ime ka o guzosie ike.

17 N’otù uzọ ahu Chineke, ebe Ọ nēzube igosibiga ndi-nketa nke nkwa-Ya ókè kari na izù-Ya bu ihe nādighi-agha agha, O were iṅu-iyí b͕o okwu:

18 ka ayi we were ihe abua nādighi-agha, nke Chineke nāpughi ikwu okwu-ugha nime ha, nwe nkasi-obi siri ike, ayi, bú ndi b͕abàra ijidesi olile-anya ahu ike, bú nke edebere n’iru ayi;

19 bú olile-anya nke ayi nwere dika ihe njiko nke nkpuru-obi, nke bu ihe-ntukwasi-obi na ihe nēguzosi ike, nke nābà kwa nime ebe ahu nke di nime ákwà-nb͕ochi;

20 n’ebe Jisus batara n’ihi ayi dika onye nēbu uzọ b͕a ọsọ, ebe emere Ya ka Ọ buru onye-isi-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi dika usoro nke Melkizedek si di.

Categories
NDI-HIBRU

NDI-HIBRU 7

1 N’ihi na Melkizedek nka, eze Selem, onye-nchu-àjà nke Chineke Onye kachasi ihe nile elu, onye zutere Abraham mb͕e o si n’ob͕ub͕u ndi-eze ahu laghachi, we gọzie ya,

2 onye Abraham kè-kwa-ra otù uzọ n’uzọ iri n’ihe nile nye, (ebe ọ bu mbu, ma asugharia aha-ya, Eze nke ezi omume, buru kwa ma emesia Eze nke Selem, nke bu, Eze nke udo;

3 enweghi nna, enweghi nne, enweghi akukọ osuso-ọmumu, enweghi nmalite ubọchi ma-ọbu ọgwugwu ndu, ma emewo ya ka o yie Ọkpara Chineke), ọ nānọgide onye-nchu-àjà mb͕e nile.

4 Ma lenu otú onye a di uku, onye Abraham, bú nna-ayi mbu, nyere otù uzọ n’uzọ iri n’isi ihe alutara n’agha.

5 Ọ bu kwa ezie na ndi ahu ndi si n’etiti umu Livai puta ndi nānara ọlu onye-nchu-àjà nwere ihe enyere n’iwu inara ndi Israel otù uzọ n’uzọ iri dika iwu-ha si di, nke ahu bu, inara umu-nne-ha, ọ bu ezie na ha esiwo n’afọ Abraham puta:

6 ma onye ahu nke anēsiteghi na ha gu akukọ osuso-ọmumu-ya anarawo Abraham otù uzọ n’uzọ iri, gọzi kwa onye nwere nkwa ndia.

7 Ma apughi ikwugide nka okwu ọ bula na onye ka nma nāgọzi onye dikariri ntà.

8 Ọzọ, n’ebe a madu ndi nānwu anwu nānata otù uzọ n’uzọ iri; ma n’ebe ahu otù onye nānata ha, nke anāb͕ara ya àmà na ọ di ndu.

9 Agēkwu otú a, na ọbuná Livai, onye nānata otù uzọ n’uzọ iri, na o site-kwa-ra n’aka Abraham nye otù uzọ n’uzọ iri;

10 n’ihi na ọ nānọ n’aha nna-ya n’oge ahu, mb͕e Melkizedek zutere ya.

11 Ya mere ọ buru na ewere ọnọdu ndi-nchu-àjà ndi Livai me ka madu zue okè (n’ihi na ndi Israel anatawo iwu n’okpuru ya), nkpà gini ọzọ di ka onye-nchu-àjà di iche bilie dika usoro Melkizedek si di, ka aghara kwa igu ya dika usoro Eron si di?

12 N’ihi na ebe enyeworo ọnọdu ndi-nchu-àjà ahu, ọ di nkpà ka ọdida nke iwu puta kwa.

13 N’ihi na Onye ahu anēkwu ihe ndia bayere Ya eketawo òkè n’ebo di iche, nke ọ dighi onye ọ bula nyeworo aka n’ebe-ichu-àjà site na ya.

14 N’ihi na ọ putawo ìhè na Onye-nwe-ayi esiwo na Juda rọputa; bú ebo nke Moses nēkwughi ihe ọ bula bayere ndi-nchu-àjà nye ya.

15 Ihe ayi nēkwu aputabigawo kwa ìhè ókè nke-uku kari, ma ọ buru na Onye-nchu-àjà di iche ebilie dika oyiyi Melkizedek si di,

16 Onye emeworo Ya ka Ọ buru onye-nchu-àjà, ọ bughi dika iwu nke ihe enyere n’iwu nye anu-aru si di, kama dika ike nke ndu nādighi-agwu agwu si di:

17 n’ihi na anāb͕ara Ya àmà, si,

Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi

Dika usoro Melkizedek si di.

18 N’ihi na emere ka ihe eburu uzọ nye n’iwu ghara idi irè n’ihi adighi-ike-ya na abaghi-urù-ya,

19 (n’ihi na iwu ahu emeghi ihe ọ bula ka o zue okè), ewe webata olile-anya ka nma, nke ayi ji biaru Chineke nso.

20 Otú ọ dighi kwa ma ejighi iṅu-iyi,

21 (n’ihi na ọ bu ezie na emewo ha ka ha buru ndi-nchu-àjà nāṅughi iyi; ma emewo Ya onye-ya n’iṅu iyi site n’aka Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Ya, si,

Onye-nwe-ayi ṅuru iyi, Ọ gaghi-echèghari kwa uche-Ya,

Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi);

22 ọ bu kwa n’uzọ ra otú a ka emeworo Jisus ka Ọ buru onye-ala ebe nke ọb͕ub͕a-ndu ka nma.

23 Ọ bu kwa ezie na emewo ndi ahu ka ha buru ndi-nchu-àjà riri nne, n’ihi na ọnwu nēb͕ochi ha inọgide:

24 ma Ya onwe-ya, n’ihi na Ọ nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi, O nwere ọnọdu-onye-nchu-àjà-Ya nādighi-agabiga onye ọzọ.

25 O site-kwa-ra na nka pu izọputachasi ndi nēsite n’aka Ya abiakute Chineke, ebe Ọ nādi ndu mb͕e nile iriọ aririọ n’ihi ha.

26 N’ihi na onye-isi-nchu-àjà di otú a kwesiri ayi, Onye di ọcha n’obi, Onye nēnweghi obi ọjọ, Onye anēmerughi emeru, Onye ekewapuworo n’etiti ndi-nmehie, me kwa Ya ka Ọ di elu kari elu-igwe nile;

27 Onye ọ nādighi Ya nkpà kwa-ubọchi, dika ndi-isi-nchu-àjà ahu, ichu àjà di iche iche, mbu n’ihi nmehie nile nke aka ya, emesia n’ihi nmehie nile nke ndi Israel: n’ihi na nka ka O mere nání otù mb͕e, mb͕e Ọ churu Onwe-ya dika àjà.

28 N’ihi na iwu nēdo madu ndi-isi-nchu-àjà, ndi nādighi ike; ma okwu nke iṅu-iyi ahu, nke soro iwu ahu n’azu, nēdo Ọkpara, Onye emeworo Ya ka O zue okè rue mb͕e ebighi-ebi.

Categories
NDI-HIBRU

NDI-HIBRU 8

1 Ma isi ihe n’ihe nile ayi nēkwu bu nka: Ayi nwere onye-isi-nchu-àjà di otú a, Onye nọduru ala n’aka-nri nke oche-eze nke Idi-uku ahu di nime elu-igwe,

2 Onye nēfè òfùfè n’ebe nsọ ahu, na n’ezi ulo-ikwū ahu, nke Onye-nwe-ayi mara, ọ bughi madu.

3 N’ihi na anēdo onye-isi-nchu-àjà ọ bula iche onyinye na àjà di iche iche n’iru Chineke: o sitere na nka di nkpà ka Onye-isi-nchu-àjà nka nwe kwa ihe iche n’iru Chineke.

4 Ya mere ọ buru na Ọ nọ n’uwa, Ọ gaghi-abu onye-nchu-àjà ma-ọli, ebe ndi nēche onyinye ahu nile n’iru Chineke dika iwu si di nọ:

5 ndi-nchu-àjà ndi nēkpe ekpere nime ihe-nṅomi na onyinyo nke ebe di n’elu-igwe, dika Chineke duworo Moses ọdú mb͕e ọ gaje imazu ulo-ikwū ahu: n’ihi na Ọ nāsi, Le anya ka i me ihe nile dika ihe-atù ahu si di nke egosiri gi n’ugwu.

6 Ma otú ọ di, O ruwo n’ifè-òfùfè nke ka nma, n’uzọ ra otú Ọ bu kwa onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ka nma, bú ọb͕ub͕a-ndu nke enyeworo n’iwu n’elu nkwa ufọdu ka nma.

7 N’ihi na asi na ọb͕ub͕a-ndu mbu ahu adighi ita uta, agaghi-achọwori ebe nye ọb͕ub͕a-ndu nke-abua.

8 N’ihi na mb͕e Ọ nāta ha uta, Ọ si,

Le, ubọchi nābia, ka Onye-nwe-ayi kwuru,

Mb͕e Mu na ulo Israel na ulo Juda gāb͕a ọb͕ub͕a-ndu ọhu;

9 Ọ bughi dika ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke Mu na ndi bu nna-ha b͕ara

N’ubọchi M’jidere ha n’aka isi n’ala Ijipt duputa ha;

N’ihi na ha onwe-ha anọgideghi n’ọb͕ub͕a-ndum,

Mu onwem lefukwara ha anya, ka Onye-nwe-ayi kwuru,

10 N’ihi na nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ulo Israel gāb͕a

Mb͕e ubọchi nile ahu gasiri, ka Onye-nwe-ayi kwuru;

M’gētiye iwum n’uche-ha,

Ọ bu kwa n’obi-ha ka M’gēdekwasi ha dika n’akwukwọ:

M’gābu-kwa-ra ha Chineke,

Ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi:

11 Ha agaghi-izírita onwe-ha ma-ọli, onye ọ bula ọ nēzí onye obodo-ya,

Onye ọ bula ọ nēzí kwa nwa-nne-ya, si, Mara Onye-nwe-ayi:

N’ihi na ha nile gāmatam,

Site n’onye dikarisiri ntà rue onye dikarisiri uku nime ha.

12 N’ihi na M’gēmere ajọ omume nile ha ebere,

M’gaghi-echeta kwa nmehie nile ha ọzọ ma-ọli.

13 Mb͕e Ọ nāsi, Ọb͕ub͕a-ndu ọhu, O mewo nke-mbu ka ọ buru ihe ochie. Ma ihe nēme ochie, nke nāka kwa nká, ga-apu-n’anya nso.

Categories
NDI-HIBRU

NDI-HIBRU 9

1 Ya mere, ọbuná ọb͕ub͕a-ndu mbu nwere ihe di iche iche aguru n’ihe ziri ezi n’ikpere Chineke, nwe kwa ebe nsọ ya, bú ebe nsọ nke uwa nka.

2 N’ihi na edoziri ulo-ikwū, ulo mbu, nke ihe-idọba-oriọna ahu, na table ahu, na ob͕e achicha ahu anēche n’iru Chineke di nime ya; nke anākpọ Ebe Nsọ.

3 Ma mb͕e agabigasiri ákwà-nb͕ochi nke-abua, ulo-ikwū nke anākpọ Ebe Nsọ kachasi ebe nsọ nile di;

4 nke nwere ebe-ichu-àjà ọla-edo isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke amachitara ọla-edo gburugburu n’akuku nile, nke ite ọla-edo nke nwere manna di nime ya, ya na nkpa-n’aka ahu nke Eron nke mara ifuru, na mbadamba nkume abua nke ọb͕ub͕a-ndu ahu;

5 ma n’elu ya cherubim nke ebube di nēnye ebe anēme ka obi Chineke juru ǹdò; nke ayi nēnweghi ike ikwu okwu bayere ha n’otù n’otù ub͕u a.

6 Ma ebe edoziworo ihe ndia otú a, ndi-nchu-àjà nābà n’ulo-ikwū mbu mb͕e nile, nēkpezu ekpere nile ha;

7 ma nání onye-isi-nchu-àjà nābà n’ulo-ikwū nke-abua, nání otù mb͕e n’arọ, nāb͕aghi aka ọbara, nke ọ nēche n’iru Chineke n’ihi onwe-ya, na n’ihi amaghi-ama nile nke ndi Israel:

8 n’ihi na Mọ Nsọ nēgosi nka, na akēmeghi ka uzọ ibà n’ebe nsọ ahu puta ìhè, mb͕e ulo-ikwū mbu ahu nēguzogide ub͕u a:

9 bú ulo-ikwū nke bu ulọ aturu oge nke di ub͕u a; anēche kwa ma onyinye ma àjà n’iru Chineke dika ulo-ikwū ahu si di, bú ihe nāpughi ime onye nēkpe ekpere ka o zu okè n’akuku akọ-na-uche,

10 ebe ha bu nání (ha na ihe-oriri na ihe-ọṅuṅu na ime-baptism di iche iche) ihe di iche iche nke anu-aru aguru n’ihe ziri ezi, enyere n’iwu rue oge imezi ihe.

11 Ma Kraist, ebe Ọ biara ka Ọ buru onye-isi-nchu-àjà nke ezi ihe nile gaje ibia, O sitere n’ulo-ikwū ahu nke ka uku na nke zuru okè kari, ọ bughi nke eji aka me, nke isi-ya bu, ọ bughi nke òkìkè a,

12 O siteghi kwa n’ọbara nke ewu na nke umu-ehi, kama O sitere n’ọbara nke Ya onwe-ya, ba n’ebe nsọ nání otù mb͕e, ebe Ọ chọputara nb͕aputa ebighi-ebi.

13 N’ihi na asi na ọbara nke ewu na nke oke-ehi, na ntu nke nwa-ab͕ọghọ-ehi, mb͕e ọ nēfesa ndi emeruworo emeru, nēdo madu nsọ ime ka anu-aru-ha di ọcha:

14 ọ̀bara Kraist, Onye sitere n’aka Mọ ebighi-ebi che Onwe-ya nātaghi uta n’iru Chineke, gēsi aṅa ghara ime akọ-na-uche-ayi ka ọ di kari ọcha nke-uku ri nne pua n’ọlu nile nwuru anwu ikpere Chineke di ndu?

15 Ọ bu kwa n’ihi nka ka Ọ bu onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ọhu, ka ọ gābu, ebe otù Onye nwuru ib͕aputa madu n’aka njehie nile nke di n’okpuru ọb͕ub͕a-ndu mbu ahu, ka ndi akpọworo we nata nkwa nke nketa ebighi-ebi ahu.

16 N’ihi na ebe ọb͕ub͕a-ndu di, ọ di nkpà ka ọnwu nke onye b͕ara ya di ya.

17 N’ihi na ọb͕ub͕a-ndu nēguzosi ike n’elu ndi nwuru anwu: n’ihi na ò nwere uzọ ọ gābu ihe di ike mb͕e ọ bula onye b͕ara ya di ndu?

18 Ya mere emeghi ọbuná ọb͕ub͕a-ndu mbu ahu ọhu nējighi ọbara.

19 N’ihi na mb͕e Moses gwarari ndi Israel nile ihe nile ọ bula enyere n’iwu dika iwu ahu si di, ọ nara ọbara nke umu-ehi na ewu nile, ya na miri na aji-anu uhie na hyssop, we fesa akwukwọ ahu onwe-ya, na ndi Israel nile,

20 si, Nka bu ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Chineke nyere unu n’iwu.

21 O we were ọbara ahu fesa kwa ulo-ikwū ahu na ihe nile nke ifè-òfùfè-ya otú ahu.

22 Ọ fọduru ihe ntà ka m’si na eji kwa ọbara eme ihe nile ka ha di ọcha, dika iwu-ayi si di, ọ buru kwa na nwusì ọbara adighi nb͕aghara nmehie adighi.

23 Ya mere ọ di nkpà ka ewere ihe ndia me ka ihe-nṅomi nile nke ihe nile di n’elu-igwe di ọcha; ma ọ di nkpà ka ewere àjà ka ndia nma me ihe ahu onwe-ha nke di n’elu-igwe ka ha di ọcha.

24 N’ihi na Kraist abàghi n’ebe nsọ eji aka me, bú ihe-atù yiri ebe nke bu ebe nsọ n’ezie; kama Ọ bàra n’elu-igwe onwe-ya, igosi Onwe-ya n’iru Chineke n’ihi ayi ub͕u a:

25 ọ bughi kwa ka O we nēche Onwe-ya n’iru Chineke ọtutu mb͕e; dika onye-isi-nchu-àjà nēwere ọbara nābughi nke ya nābà n’ebe nsọ kwa-arọ;

26 n’ihi na asi na ọ di otú a Ọ ghaghi ihu ahuhu ọtutu mb͕e site na ntọ-ala nke uwa: ma otú ọ di, ọ bu nání otù mb͕e nime nruzu nke oge ndia ka emeworo ka Ọ puta ìhè, ka O we site n’ichu Onwe-ya dika àjà me ka nmehie ghara idi irè.

27 Dika ọ bu kwa ihe edebeworo madu ka ha nwua anwu nání otù mb͕e, ma mb͕e nka gasiri ikpé eso ya;

28 n’uzọ ra otú a Kraist, ebe echere Ya n’iru Chineke nání otù mb͕e iburu nmehie nile nke ọtutu madu, Ọ gēme kwa ka ndi nēche Ya hu Ya anya nke ub͕ò abua, ma nmehie adighi ya, ka ewe zọputa ha.

Categories
NDI-HIBRU

NDI-HIBRU 10

1 N’ihi na iwu ahu, ebe o nwere nání onyinyo nke ezi ihe ahu nile gaje ibia, ọ bughi ezi oyiyi onwe-ya nke ihe ndia, ha apughi ime ka ndi nābiaru ha nso zue okè mb͕e ọ bula, site n’otù àjà ndia nke ha nēche n’iru Chineke kwa-arọ mb͕e nile.

2 N’ihi na ma ọ dighi otú a, àgaghi-echebìwori ha n’iru Chineke, n’ihi na ndi nēkpe ekpere, ebe emeworo ka ha di ọcha otù mb͕e, ha agaghi-enwe akọ-na-uche ọ bula nke nmehie di iche iche ọzọ?

3 Ma nime àjà ndia ncheta nke nmehie di kwa-arọ.

4 N’ihi na ọbara nke oke-ehi na nke ewu apughi iwepu nmehie.

5 N’ihi nka mb͕e Ọ nābia n’uwa, Ọ si,

Àjà na ihe echere n’iru Gi, I chọghi ha,

Ma aru ka I kwadebere nyem;

6 Àjà-nsuresi-ọku na àjà achuru bayere nmehie, ha abughi ihe di Gi ezi nma:

7 Mb͕e ahu ka M’siri, Le, abiawom

(N’akwukwọ-npiakọta ka edeworo ihe bayerem)

Ime ihe I nācho, Chineke.

8 Mb͕e O buru uzọ kwu, si, Àjà na ihe echere n’iru Gi na àjà-nsuresi-ọku na àjà achuru bayere nmehie, I chọghi ha, ha abughi kwa ihe di Gi ezi nma (bú ihe anēche n’iru Chineke dika iwu si di),

9 mb͕e ahu ka Ọ siworo, Le, abiawom ime ihe I nāchọ. Ọ nēwepu nke-mbu, ka O we me ka nke-abua guzo.

10 Ọ bu kwa n’ọchichọ a ka edoworo ayi nsọ site n’iche aru Jisus Kraist n’iru Chineke dika àjà nání otù mb͕e.

11 Onye-nchu-àjà ọ bula nēguzo kwa kwa-ubọchi nēfè òfùfè nēche kwa otù àjà ndia n’iru Chineke ọtutu mb͕e, bú àjà nke nāpughi ihichapu nmehie mb͕e ọ bula:

12 ma Onye ahu, mb͕e O chereri otù àjà n’iru Chineke n’ihi nmehie, O we nọdu n’aka-nri Chineke mb͕e nile;

13 nēle anya n’oge fọduru rue mb͕e agēdo ndi-iro-Ya dika ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Ya abua.

14 N’ihi na O sitewo n’iche Onwe-ya n’iru Chineke dika àjà otù mb͕e me ka ndi anēdo nsọ zue okè mb͕e nile.

15 Mọ Nsọ nāb͕a-kwa-ra ayi àmà: n’ihi na mb͕e O kwuru, si,

16 Nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ha gāb͕a

Mb͕e ubọchi ahu gasiri, ka Onye-nwe-ayi kwuru;

M’gētiye iwum n’obi-ha,

Ọ bu kwa n’uche-ha ka M’gēdekwasi ha dika n’akwukwọ;

mb͕e ahu Ọ si,

17 M’gaghi-echeta kwa nmehie nile ha na nmebi-iwu nile ha ọzọ ma-ọli.

18 Ma ebe nb͕aghara ihe ndia di, iche àjà n’iru Chineke bayere nmehie adighi ọzọ.

19 Ya mere, umu-nnam, ebe ayi nwere nkwuwa-okwu ibà n’ebe nsọ ahu site n’ọbara Jisus,

20 bú uzọ O mere ọhu nye ayi, nke di ọhu di kwa ndu, site n’ákwà-nb͕ochi, nke ahu bu, anu-aru-Ya;

21 ebe ayi nwe-kwa-ra Onye-nchu-àjà uku edoro onye-isi èzí-na-ulo Chineke;

22 ka ayi were obi ezi-okwu biarue nso nime nkwezu nke okwukwe, buru kwa ndi efesaworo ọbara n’obi-ayi pua n’ajọ akọ-na-uche, ndi asachawo-kwa-ra aru-ayi na miri di ọcha:

23 ka ayi jidesie nkwuputa nke olile-anya-ayi ike ka ọ ghara iruda n’ala; n’ihi na Onye ahu Nke kwere nkwa kwesiri ntukwasi-obi:

24 ka ayi nātugharita kwa uche n’aru ibe-ayi ikpasu ihu-n’anya na ọlu ọma di iche iche;

25 ka ayi ghara kwa irapu nzukọ nke onwe-ayi, dika ufọdu nēme, kama ka ayi nādusi ndi ọzọ ọdu ike; ka ayi me kari kwa otú a, n’uzọ ra otú unu nēle ubọchi ahu anya ka ọ nābiaru nso.

26 N’ihi na asi na ayi were ọchichọ-obi nānọ na nmehie mb͕e ayi nataworo nmazu nke ezi-okwu, àjà agāchu bayere nmehie di iche iche afọdughi ọzọ,

27 kama nke fọduru bu oké olile-anya di egwu nke ikpé, ya na ọku nēre ike ike nke gaje iripia ndi nēguzogide Chineke.

28 Onye ọ bula nke juworo iwu Moses gānwu anwu nēmereghi ya ebere n’okwu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ:

29 ma àhuhu ahu jọkariri njọ ra aṅa, bú nke agāgu na onye ahu kwesiri ka enye ya, ka unu chère, bú onye nke zọworo Ọkpara Chineke ukwu, onye guwo-kwa-ra ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú nke eji do ya nsọ, n’ihe emeruru emeru, onye mewo-kwa-ra Mọ nke amara ihe-ihere?

30 N’ihi na ayi matara Onye ahu Nke siri, Mu nwe ọ́bọ̀, Mu onwem gēnyeghachi. Ọzọ kwa, Onye-nwe-ayi gēkpe ndi-Ya ikpé.

31 Ọ bu ihe di egwu idabà n’aka Chineke di ndu.

32 Ma nēchetanu ubọchi mbu ahu, nke ọ bu nime ha, mb͕e enyesiri unu ìhè, ka unu tachiri obi n’oké ib͕a-nb͕a nke ahuhu di iche iche;

33 n’otù akuku, ebe ewere ita-uta na nkpab͕u di iche iche me unu ka unu buru ihe-nkiri; n’akuku ọzọ, ebe unu ghọrọ ndi nēso ndi nēbi obi otú a nwekọ ahuhu.

34 N’ihi na unu ji obi so ndi nọ n’ab͕u hukọ ahuhu, unu were kwa ọṅù nara npunara ahu nke-ọma, bú nke apunara unu ihe nile unu nwere, ebe unu mara na unu nwere onwe-unu dika ihe unu nwere, bú ihe ka nma nke nādigide kwa.

35 Ya mere unu etufula nkwuwa-okwu-unu, bú ihe nke nwere oké nnyeghachi nke ugwọ-ọlu.

36 N’ihi na ntachi-obi di unu nkpà, ka ọ gābu, mb͕e unu meworo ihe Chineke nāchọ, ka unu we nata nkwa ahu.

37 N’ihi na le ka nwa oge ntà fọduru ra,

Onye ahu Nke nābia gābia, Ọ gaghi-anọ kwa ọdù.

38 Ma onye ezi omume nkem gēsite n’okwukwe di ndu:

Ọ buru kwa na ọ gēwezuga onwe-ya, ihe-ya adighi nkpuru-obim ezi nma.

39 Ma ayi onwe-ayi adighi n’etiti ndi wezugara onwe-ha ila n’iyì; kama ayi di n’etiti ndi kwere ekwe inweta nkpuru-obi-ha.