Categories
NDI GALETIA

NDI GALETIA 1

1 Pọl, onye-ozi (ọ bughi site na madu, o siteghi kwa n’aka madu, kama o sitere n’aka Jisus Kraist, site kwa n’aka Chineke, bú Nna, Onye mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie),

2 na umu-nna-ayi nile ndi mu na ha nọ, ayi nēdegara nzukọ Kraist nile nke Galetia akwukwọ:

3 Amara diri unu na udo nke si n’aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.

4 Onye nyere Onwe-ya n’ihi nmehie nile ayi, ka O weputa ayi n’ajọ oge nke di ub͕u a, dika ọchichọ nke Chineke, bú Nna-ayi, si di:

5 Onye otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

6 Ọ nējum anya na unu nēsi n’aka Onye kpọrọ unu n’amara Kraist b͕abiga ọsọsọ otú a n’ozi ọma di iche;

7 nke nābughi ozi ọma ọzọ: ọ bu nání na ufọdu di ndi nēme ka obi lọ unu miri, ndi nāchọ kwa itughari ozi ọma Kraist.

8 Ma asi kwa na ayi onwe-ayi, ma-ọbu mọ-ozi nke sitere n’elu-igwe, gēzì unu ozi ọma ọzọ tukwasi ozi ọma nke ayi zìri unu, ya buru anathema (onye mmegide).

9 Dika ayi kwuworo n’oge gara aga, anamekwu kwa ya ub͕u a ọzọ, Ọ buru na onye ọ bula nēzì unu ozi ọma ọzọ tukwasi nke unu natara, ya buru anathema (onye mmegide).

10 N’ihi na ọ̀ bu madu ka m’nēme ka ha kweye ub͕u a, ma-ọbu Chineke? ma-ọbu ànamachọ uzọ ime ihe gātọ madu utọ? ọ buru na anọm nēme ihe gātọ madu utọ, m’gaghi-abuwori orù nke Kraist.

11 N’ihi na emem ka unu mara, umu-nnam, na ozi ọma m’zisara, na ọ bughi nke mmadu chèputara.

12 N’ihi na mu onwem anataghi kwa ya site na madu, ọ dighi kwa onye zírim ya, kama a nuru m site na nkpughe nke Jisus Kraist.

13 N’ihi na unu nuru ihe bayere ibi-obim n’oge gara aga n’uzọ ndi-Ju, na anamesob͕u nzukọ Chineke nke-uku ri nne, mebi kwa ya:

14 anamaga-kwa-ri n’iru n’uzọ ndi-Ju kari ọtutu ndi-ọb͕ọm n’etiti mba nkem, ebe obim nānubigara ozizí ahu ọku ókè kari, bú nke nnam-hà nyere ayi n’aka idebe.

15 Ma mb͕e ọ di Chineke ezi nma, bú Onye sitere n’oge m’nọ n’afọ nnem kewaputam, site kwa n’amara-Ya kpọm,

16 mb͕e ọ di Ya ezi nma ikpughe Ọkpara-Ya nimem, ka m’we zisa ozi ọma Ya n’etiti ndi mba ọzọ; ngwa ngwa mu na anu-aru na ọbara ab͕aghi ìzù:

17 arigoghm kwa na Jerusalem jekuru ndi burum uzọ buru ndi-ozi: kama ejerem Arebia; we laghachi na Damaskọs ọzọ.

18 Mb͕e ahu mb͕e arọ atọ gasiri arigorom na Jerusalem ileta Kifas, mu na ya we nọgide ubọchi iri na ise.

19 Ma ahughm onye ọzọ n’etiti ndi-ozi, ma ọ bu nání Jemes nwa-nne Onye-nwe-ayi.

20 Ma ihe ndia nke m’nēdegara unu, le, n’iru Chineke, na ekwughm okwu-ugha.

21 Mb͕e ahu abiarurum akuku nile Siria na Silisia.

22 Ma nzukọ nile nke Judia nke di nime Kraist nọ nāmaghi irum:

23 ma ọ bu nání na ha nānu, si, Onye ahu nke nēsob͕u ayi n’oge gara aga, ọ nēzì ozi ọma ub͕u a nke okwukwe ahu nke ọ nēmebi n’oge gara aga;

24 ha we nēnye Chineke otuto n’ihe ha huru n’arum.

Categories
NDI GALETIA

NDI GALETIA 2

1 Mb͕e ahu mb͕e arọ iri na anọ gasiri arigorom na Jerusalem ọzọ, mu na Banabas, m’kpọrọ kwa Taitọs ka mu na ya yikọ je.

2 Ma arigorom n’uzọ nkpughe; m’we debe n’iru ha ozi ọma ahu nke m’nēkwusa n’etiti ndi mba ọzọ, ma edeberem ya n’iru ndi akpọrọ ihe mb͕e ha nọ iche, ka m’ghara ibu onye nāb͕a ọsọ ma-ọbu onye b͕arari ọsọ n’efu n’uzọ ọ bula.

3 Ma ọbuná Taitọs, onye mu na ya nọ, ebe ọ bu onye-Grik, erugideghi ya ka ebì ya úgwù:

4 ma n’ihi umu-nna ugha ndi ekubatarari na nzuzo, madu ndi b͕ebatara ka ha ledo inwe-onwe-ayi nke ayi nwere nime Kraist Jisus, ka ha we me ka ayi buru orù:

5 ndi ayi nēnyeghi uzọ n’uzọ ido onwe-ayi n’okpuru ha, é-è, ọ bughi otù oge hour; ka ezi-okwu nke ozi ọma we nọgide n’etiti unu.

6 Ma site n’ọnu ndi akpọrọ ihe (aha madu ha buri n’oge gara aga, o meghi ihe di iche n’anyam: Chineke adighi-ele madu anya n’iru) asim, na ndi ahu akpọrọ ihe enyeghm ìzù ọ bula:

7 kama n’akuku ọzọ, mb͕e ha huru na enyereri ozi ọma nke ndi ebìghi-úgwù n’akam na ntukwasi-obi idebe, dika enyereri Pita ozi ọma nke ndi obibi-úgwù n’aka idebe

8 (n’ihi na Onye lusiri Pita ọlu ike ka ọ we lua ọlu onye-ozi nke ndi obibì-úgwù, Onye ahu lusikwara m ọlu ike ka m’we jekuru ndi mba ọzọ);

9 mb͕e ha hukwara amara enyerem, Jemes na Kifas na Jọn, bú ndi akpọrọ ide, nara mu na Banabas aka-nri nke nnwekọ, ka ayi onwe-ayi we jekuru ndi mba ọzọ, ka ha onwe-ha we jekuru kwa ndi obibì-úgwù;

10 ọ bu nání na ha chọrọ ka ayi cheta ndi-obeye; nke m’nuru ọku n’obi ime otù ihe ahu.

11 Ma mb͕e Kifas biaruru Antiọk, eguzogiderem ya n’iru, n’ihi na ọ nọ n’ọmuma-ikpé.

12 N’ihi na mb͕e madu ufọdu akēsighi n’ebe Jemes nọ bia, ya na ndi mba ọzọ nērikọ ihe: ma mb͕e ha biara, o wezugabara we kewapu onwe-ya, ebe ọ nātu egwu ndi obibì-úgwù.

13 Ndi-Ju fọduru we so ya n’inwe kwa iru-abua; nke mere ka iru-abua-ha dọrọ Banabas onwe-ya iso ha.

14 Ma mb͕e m’huru na ha agazighi dika ezi-okwu nke ozi ọma si di, asirim Kifas n’iru ha nile, Ọ buru na gi onwe-gi adi ndu dika ndi mba ọzọ, ma ọ bughi dika ndi-Ju, ọ bu ezie na i bu onye-Ju, ì si aṅa erugide ndi mba ọzọ ka ha so uzọ ndi-Ju?

15 Ayi onwe-ayi, ọ bu ezie na ayi bu ndi-Ju dika esi mu ayi, buru kwa ndi nābughi ndi-nmehie ndi sitere na ndi mba ọzọ,

16 ma ebe ayi matara na agughi madu n’onye ezi omume site n’ọlu di iche iche nke iwu, ma ọ bu nání okwukwe ekwere na Jisus Kraist ka eji gu madu n’onye ezi omume, ọbuná ayi onwe-ayi kwere na Kraist Jisus, ka ewe gua ayi na ndi ezi omume site n’okwukwe ayi kwere na Kraist, ọ bughi kwa site n’ọlu di iche iche nke iwu: n’ihi na site n’ọlu di iche iche nke iwu ọ dighi anu-aru ọ bula, bú madu, agāgu n’onye ezi omume.

17 Ma ọ buru na ahuru na ayi onwe-ayi bu kwa ndi-nmehie, mb͕e ayi nāchọ uzọ agēsi gu ayi na ndi ezi omume nime Kraist, ọ̀ bu na Kraist bu onye nēje ozi nmehie? Chineke ekwela.

18 N’ihi na asi na ihe m’kwaturu, ihe ndia ka m’nēwuli elu ọzọ dika ulo, anameme ka madu mara na abum onye-njehie.

19 N’ihi, na mu onwem sitere n’aka iwu nwua n’ebe iwu di, ka m’we di ndu n’ebe Chineke nọ

20 Akpọgidekọwo mu na Kraist n’obe; ọ bughi kwa mu onwem nādi ndu ọzọ, kama ọ bu Kraist nādi ndu nimem ma ndu ahu m’nādi n’anu-aru ub͕u a, anamadi ya n’okwukwe, bú nke m’kwere n’Ọkpara Chineke, Onye hurum n’anya, rara kwa Onwe-ya nye n’ihim.

21 Ajughm amara nke Chineke: n’ihi na asi na ezi omume abia site n’aka iwu, ya mere Kraist nwuru n’efu.

Categories
NDI GALETIA

NDI GALETIA 3

1 Ma ndi Galetia nēnweghi uche, ònye riri obi-unu, ndi ewere Jisus Kraist gosi ọra madu n’anya-unu, dika Onye akpọgidereri n’obe?

2 Náni nka ka m’nāchọ imata n’ọnu-unu, Ùnu sitere n’ọlu di iche iche nke iwu nata Mọ Nsọ, ma-ọbu na unu sitere n’ọnunu nke okwukwe nata Ya?

3 Ùnu bu ndi nēnweghi uche otú a? ebe unu malitere na Mọ Nsọ, ọ̀ bu n’anu-aru ka anēme ka unu zue okè ub͕u a?

4 Ùnu huru ọtutu ahuhu di otú a n’efu? ma asi na ọ bu ezie na unu huru ha n’efu.

5 Ya mere Onye ahu Nke nwe inyezu unu Mọ Nsọ, Nke nāluputa kwa ọlu di ike nime unu, Ò sitere n’ọlu di iche iche nke iwu ma-ọbu na o sitere n’ọnunu nke okwukwe nēme ya?

6 Dika Abraham kwere Chineke, ewe gua nke ahu nye ya n’ezi omume.

7 Ya mere maranu na ndi sitere n’okwukwe, ndi ahu bu umu Abraham.

8 Ma ihe edeworo n’akwukwọ nsọ, ebe o buru uzọ hu na Chineke nēsite n’okwukwe gu ndi mba ọzọ na ndi ezi omume, o buru uzọ zìe Abraham ozi ọma, si, Agāgọzi mba nile nime gi.

9 Ya mere ndi sitere n’okwukwe, ndia ka anāgọzi, ha na onye okwukwe ahu, bú Abraham.

10 N’ihi na ka ha ra, bú ndi sitere n’ọlu nke iwu, ha nọ n’okpuru ọbubu-ọnu: n’ihi na edewo ya n’akwukwọ nsọ, si, Onye anābu ọnu ka ọ bu, bu onye ọ bula nke nānọgideghi n’ihe nile edeworo n’akwukwọ iwu, ime ha.

11 Ma ọ putara ìhè na ọ dighi onye ọ bula anāgu n’onye ezi omume n’iwu n’iru Chineke: n’ihi na, Onye ezi omume gēsite n’okwukwe di ndu;

12 ma iwu ahu esiteghi n’okwukwe; kama, Onye nēme ihe ndia gādi ndu nime ha.

13 Kraist b͕aputara ayi n’ọbubu-ọnu nke iwu ahu, ebe Ọ ghọrọ ọbubu-ọnu n’ọnọdu-ayi: n’ihi na edewo ya n’akwukwọ nsọ, si, Onye anabu ọnu ka ọ bu, bú onye ọ bula nke anākwuba n’elu osisi:

14 ka ngọzi nke Abraham we rue ndi mba ọzọ nime Kraist Jisus; ka ayi we site n’okwukwe ahu nara nkwa Nke bu Mọ Nsọ.

15 Umu-nnam, anamekwu dika madu: Asi na ọ bu nání ọb͕ub͕a-ndu madu, mb͕e edozisiri ya nke-ọma, ọ dighi onye ọ bula nēwezuga ya, ma-ọbu nētiye ihe ọzọ nime ya.

16 Ma ọ bu Abraham ka ekwere nkwa ndia, ya na Nkpuru-ya. Ọ sighi, Na nkpuru, dika Ọ nēkwu okwu bayere ọtutu; kama dika Ọ nēkwu okwu bayere otù Onye, Ọ si, Na Nkpuru-gi, Nke bu Kraist.

17 Ma nka bu ihe m’nēkwu; Ọb͕ub͕a-ndu nke Chineke buruworo uzọ dozie nke-ọma, iwu ahu, nke putara mb͕e nnù arọ na orú arọ na iri gasiri, ewezugaghi ọb͕ub͕a-ndu ahu, ime nkwa ahu ka ọ ghara idi irè.

18 N’ihi na asi na ihe-nketa ahu sitere n’iwu, o siteghi kwa na nkwa ọzọ: ma Chineke esitewo na nkwa nye Abraham ihe-nketa ahu n’amara.

19 Gini kwa bu iwu ahu? Atukwasiri ya n’ihi njehie, rue mb͕e Nkpuru ahu gābia, bú Onye ekweworo nkwa; esitekwara n’aka ndi-mọ-ozi nye iwu ahu site n’aka onye-ob͕ub͕o.

20 Ma onye-ob͕ub͕o abughi nke otù onye; ma Chineke bu otù onye.

21 Ya mere, ìwu ahu nēmegide nkwa Chineke? Chineke ekwela: n’ihi na asi na enyereri iwu nke puru ime ka adi ndu, n’ezie ezi omume gēsitewori n’iwu.

22 Otú ọ di, ihe edeworo n’akwukwọ nsọ mechibidoro ihe nile n’okpuru nmehie, ka ewe were nkwa ahu nke sitere n’okwukwe ekwere na Jisus Kraist nye ndi kwere ekwe.

23 Ma mb͕e okwukwe akābiaghi, anēche ayi nche n’okpuru iwu, ebe anēmechibido ayi rue okwukwe ahu nke agaje ikpughe.

24 Ya mere iwu ahu aghọwo onye-ozìzí-ayi ikpọrọ ayi biakute Kraist, ka ewe site n’okwukwe gua ayi na ndi ezi omume.

25 Ma ebe okwukwe ahu biaworo, ayi anọghi ọzọ n’okpuru onye-ozizí.

26 N’ihi na unu nile bu umu Chineke, site n’okwukwe, nime Kraist Jisus.

27 N’ihi na ka unu ra, bú ndi emere baptism ibà nime Kraist, unu yikwasiri Kraist.

28 Onye-Ju ma-ọbu onye-Grik apughi idi, orù ma-ọbu onye nwe onwe-ya apughi idi, nwoke na nwanyi apughi idi: n’ihi na unu onwe-unu nile bu otù onye nime Kraist Jisus.

29 Ma ọ buru na unu onwe-unu bu ihe di n’aru nke Kraist, ya mere unu bu nkpuru Abraham, buru ndi-nketa dika nkwa si di.

Categories
NDI GALETIA

NDI GALETIA 4

1 Ma asim na ka oge ra onye-nketa ahu nọ ka nwa ọhu, ọ dighi iche n’ihe ọ bula n’ebe orù nọ, ọ bu ezie na ọ bu onye-nwe ihe nile;

2 kama ọ nọ n’okpuru ndi etiyere ya n’aka-ha na ndi nāchi èzí-na-ulo-ya rue oge nna-ya buru uzọ ka àka.

3 Otú a ayi onwe-ayi kwa, mb͕e ayi bu umu ọhu, ọ bu n’okpuru ihe-ozizí mbu nke uwa ka ejidere ayi dika orù

4 ma mb͕e oge ahu zuru, Chineke ziputara Ọkpara-Ya, Onye amuru site na nwanyi, Onye amuru n’okpuru iwu,

5 ka O we b͕aputa ndi nọ n’okpuru iwu, ka ayi we nata idi-ka-umu-ndikom ahu.

6 Ma n’ihi na unu bu umu-ndikom, Chineke ziputara Mọ nke Ọkpara-Ya ba nime obi-ayi, nēti nkpu, si, Aba, Nna.

7 Ya mere i bughi orù ọzọ, kama i bu nwa-nwoke; ma ọ buru na i bu nwa-nwoke, i bu kwa onye-nketa site n’aka Chineke.

8 Otú ọ di, mb͕e ahu, ebe unu nāmataghi Chineke, unu bu orù nke ndi nābughi chi dika ha si puta n’uwa:

9 ma ub͕u a, mb͕e unu maworo Chineke, ma-ọbu, nke bu ezi-okwu kari, unu bu ndi Chineke maworo, ùnu si aṅa chighari ọzọ n’ihe-ozizí mbu nādighi ike nēnweghi kwa ihe ọ bula, nke unu nācho ibu orù-ha ọzọ ọhu?

10 Unu nēlezi anya idebe ubọchi, na ọnwa, na oge, na arọ.

11 Anamatu egwu unu, ma o nwere uzọ ọ bula m’dọb͕uworo onwem n’ọlu n’aru unu n’efu.

12 Umu-nnam, ariọm unu, menu onwe-unu ka unu di ka mu onwem, n’ihi na mu onwem me-kwa-ra onwem ka m’di ka unu onwe-unu. Unu emeghm ajọ omume ọ bula:

13 ma unu matara na ọ bu n’ihi adighi-ike nke anu-aru ka m’zìri unu ozi ọma na mbu:

14 unu akpọghi kwa ihe di n’anu-arum nke bu ọnwunwa n’ebe unu nọ ihe-efu, ọ sọghi kwa unu oyi; kama unu naram nke-ọma dika mọ-ozi nke Chineke, dika Kraist Jisus.

15 Òle ebe ọ di kwa, bú ọkpukpọ unu nākpọ onwe-unu ndi ngọzi diri? n’ihi na ab͕aram unu àmà, na, ọ buru na ọ bu ihe unu puru ime, unu gāghuputawori anya-unu nyem.

16 Ya mere àghọwom onye-iro-unu, n’ihi na anamagwa unu ezi-okwu?

17 Ha were obi nānu ọku chọ unu n’uzọ nādighi nma; ma ha nāchọ imechibido unu uzọ n’èzí, ka unu we were obi nānu ọku chọ ha.

18 Ma ọ di nma ka ewere obi nānu ọku chọ unu n’ihe ọma mb͕e nile, ọ bughi kwa nání mb͕e m’nọ n’etiti unu.

19 Umu-ntakirim, unu ndi ime unu nēmem ọzọ rue mb͕e agēme ka udi Kraist di nime unu,

20 ọ gādim nọ̄ nma ma asi na apurum inọ n’etiti unu ub͕u a, na ib͕anwe olu m; n’ihi na enwerem obi abua n’ebe unu nọ.

21 Gwanum, unu ndi nāchọ inọ n’okpuru iwu, ùnu adighi-anu iwu ahu?

22 N’ihi na edewo ya n’akwukwọ nsọ, na Abraham nwere umu-ndikom abua, otù site n’orù-nwanyi ahu, otù site kwa na nwanyi ahu nke nwere onwe-ya.

23 Ma ọ bu n’uzọ anu-aru ka amuworo nwa nke sitere n’orù-nwanyi ahu; ma esitewo na nkwa mu nwa nke sitere na nwanyi ahu nwere onwe-ya.

24 Ma ewere ihe ndia ma atù: n’ihi na ndinyom abua ndia bu ọb͕ub͕a-ndu abua; otù si n’ugwu Sainai puta, nāmu umu nye n’orù, nwanyi ahu bu Hega.

25 N’ihi na Sainai nka bu ugwu di n’Arebia, ya na Jerusalem nke di ub͕u a kwu kwa: n’ihi na ọ nọ n’orù, ya na umu-ya.

26 Ma Jerusalem nke di n’elu nwere onwe-ya, ya onwe-ya bu kwa nne ayi.

27 N’ihi na edewo ya n’akwukwọ nsọ, si,

Ka obi nātọ gi utọ, nwanyi-àgà nke nādighi-amu nwa;

Tiwa nkpu ọṅù, ti kwa nkpu, gi onye ime nādighi-eme:

N’ihi na umu nke nwanyi arapuru nání ya di ọtutu kari umu nke nwanyi ahu nwere di.

28 Ma ayi onwe-ayi, umu-nnam, bu umu nke nkwa, dika Aisak.

29 Ma dika onye amuru n’uzọ anu-aru sob͕uru onye amuru n’uzọ Mọ Nsọ mb͕e ahu, ọbuná otú a ka ọ di ub͕u a.

30 Otú ọ di, gini ka ihe edeworo n’akwukwọ nsọ nēkwu? Chupu orù-nwanyi a na nwa-ya nwoke: n’ihi na nwa-nwoke orù-nwanyi agagheso nwa nke nwanyi ahu nke nwere onwe ya keta ihe.

31 N’ihi nka, umu-nnam, ayi abughi umu nke orù-nwanyi, kama ayi bu umu nke nwanyi ahu nwere onwe-ya.

Categories
NDI GALETIA

NDI GALETIA 5

1 Kraist mere ka ayi pua n’orù ka ayi we nwere onwe-ayi: ya mere nēguzosinu ike, unu ekwela ka ewere yoke nke bu ibu-orù jide unu ọzọ.

2 Le, mu onwem Pọl si unu, na, asi na unu ekwe ka ebì unu úgwù, Kraist agaghi-abara unu urù ọ bula.

3 Ma agwasim onye ọ bula ike, bú onye kwere ka ebì ya úgwù, na ọ bu onye ji ugwọ idebe iwu ahu dum.

4 Atọpuru unu n’aru Kraist, unu ndi nāchọ ka ewere iwu gua unu na ndi ezi omume; unu siri n’amara dapu.

5 N’ihi na ayi onwe-ayi ji Mọ Nsọ nēchesi ihe anēle anya ike, bú ezi omume, site n’okwukwe.

6 N’ihi na nime Kraist Jisus ọ dighi ike ọ bula obibì-úgwù ma-ọbu ebìghi-úgwù nwere; kama nke nwere ike bu okwukwe nke sitere n’aka ihu-n’anya alusi ọlu ike.

7 Unu nāb͕arì ọsọ nke-ọma; ònye b͕ochiri unu, ka unu ghara ikweyere ezi-okwu ahu?

8 Nkweye ahu emere ka unu kweye esiteghi n’Onye ahu Nke nākpọ unu.

9 Ihe-iko-achicha di ntà nēko ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ dum.

10 Mu onwem atukwasiwo obim n’ebe unu nọ nime Onye-nwe-ayi, na unu agaghi-atukwasi uche n’ihe ọ bula ọzọ: ma onye nēme ka obi lọ unu miri gēbu ikpé-ya, onye ọ bula.

11 Ma mu onwem, umu-nnam, ọ buru na anọm nēkwusa ibì-úgwù, gini mere anọ nēsob͕um? m’kwusa otú a, emewo ka ọnyà nka, bú obe, ghara idi irè.

12 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndi nēkpù unu iru gēme onwe-ha onozi.

13 N’ihi na unu onwe unu, umu-nnam, ka akpọrọ ka unu nwere onwe-unu; nání unu ewerela inwe-onwe-unu ahu nye ka ọ buru ihe anu-aru-unu gēji me ihe kama werenu ihunanya burita orù ibe-unu.

14 N’ihi na edebezuwo iwu nile n’otù okwu, bú nka; Hu onye-ab͕ata-obi-gi n’anya dika onwe-gi.

15 Ma ọ buru na unu atarita ibe-unu aru, ripia kwa ibe-unu, lezienu anya ka unu ghara ikpochapurita onwe-unu.

16 Ma asim, Nējegharinu site na Mọ Nsọ, unu agaghi-emezu kwa agu nke anu-aru maọli.

17 N’ihi na agu nāgu anu-aru megide Mọ Nsọ, agu nāgu kwa Mọ Nsọ megide anu-aru; n’ihi na ndia nēmegide onwe-ha; ka unu we ghara ime ihe ndia ọ bula unu nāchọ ime.

18 Ma ọ buru na Mọ Nsọ nēdu unu, unu anọghi n’okpuru iwu.

19 Ma ọlu nile nke anu-aru putara ìhè, nke di ka ndia, ikwa-iko, adighi-ọcha, agu ikwa-iko,

20 ikpere-arusi, igwọ-ńsí, ibu-iro, esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkewa, irọ-òtù,

21 ikpọ-asì, iṅubiga-manya-ókè, ite-egwú, na ihe yiri ihe ndia: nke m’buru uzọ gwa unu, dika m’buru uzọ gwa unu n’oge gara aga, na ndi nēme ihe di otú a agaghi-eketa ala-eze Chineke.

22 Ma nkpuru nke Mọ Nsọ bu ihu-n’anya, ọṅù, udo, ogologo-ntachi-obi; obi-ọma, idi-nma, ikwesi-ntukwasi-obi,

23 idi-nwayọ, imerū-ihe-n’ókè: ọ dighi iwu nēmegide ihe nile di otú a.

24 Ma ndi nke Kraist-ayi Jisus kpọgidere anu-aru-ha n’obe, ya na ọchichọ ọjọ nile na agu ihe ọjọ nile di ya.

25 Ọ buru na ayi di ndu site na Mọ Nsọ, ka ayi nāgazi kwa site na Mọ Nsọ.

26 Ka ayi ghara ighọ ndi nāchọ otuto efu, nāchọrita ibe-ayi okwu, nākpọrita ibe-ayi asì.

Categories
NDI GALETIA

NDI GALETIA 6

1 Umu-nnam, asi na ọ bu ezie na anwude madu mb͕e ọ nọ na ndahie ọ bula, unu onwe-unu, bú ndi Mọ Nsọ nāchi, menu ka madu di otú a guzozie nime mọ nke idi-nwayọ; nēlezi onwe-gi anya, ka aghara inwa kwa gi onwe-gi.

2 Nēburitanu ibu nānyi ibe-unu, nēdebezu-kwa-nu iwu Kraist n’uzọ di otú a.

3 N’ihi na asi na madu nēchè na ya bu ihe, mb͕e ọ nābughi ihe ọ bula, ọ nāghọ onwe-ya aghughọ n’obi.

4 Ma ka onye ọ bula nwaputa ọlu nke aka ya, mb͕e ahu ka ọ gēnwe kwa ihe ọ gānyara isi n’ebe nání ya onwe-ya nọ, ọ bughi kwa n’ebe ibe-ya nọ.

5 N’ihi na madu nile n’otù nọtù gēbu ibu nke aka ha.

6 Ma onye ewere okwu ọnu nēzi okwu Chineke, ya me ka onye nēwere okwu ọnu nēzi ya so ya nēnwekọ ezi ihe nile.

7 Una ekwela ka eduhie unu; Chineke abughi onye anēlelì: n’ihi na nkpuru ọ bula madu nāgha, nke ahu ka ọ gēweta kwa n’ubi.

8 N’ihi na onye nāgha nkpuru nye anu-aru onwe-ya gēsite n’anu-aru ahu weta nmebi dika ihe-ubi; ma onye nāgha nkpuru nye Mọ Nsọ gēsite na Mọ Nsọ weta ndu ebighi-ebi dika ihe-ubi

9 Ma ike agwula ayi n’obi n’ime ihe ọma: n’ihi na ayi gēweta ihe-ubi mb͕e oge-ya ruru, ma ayi adaghi #mbà.

10 Ya mere otú a, otú ayi nwere oge, ka ayi nālu ezi ihe n’ebe madu nile nọ, ma ka ayi nālu ezi ihe karisia n’ebe ndi èzí-na-ulo nke okwukwe-ayi nọ.

11 Lenu otú nkpuru-akwukwọ m’ji aka nkem degara unu di okpotokpo.

12 Ka ha ra, bú ndi nāchọ ka ha ma nma n’anu-aru n’iru madu, ndi ahu nērugide unu ka ebì unu úgwù; ihe ha ji me ya bu nání ka ewe ghara isob͕u ha n’ihi obe Kraist.

13 N’ihi na ndi kwere ka ebì ha úgwù, ọbuná ha onwe-ha adighi-edebe iwu; kama ha nācho ka ebì unu úgwù, ka ha we nya isi n’anu-aru unu onwe-unu.

14 Ma Chineke ekwela ka m’nya isi, ma-ọbughi n’obe Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nke esiteworo na ya kpọgide uwa n’ebe m’nọ, kpọgide kwa mu onwem n’ebe uwa di.

15 N’ihi na obibì-úgwù abughi ihe, ebìghi-úgwù abughi kwa ihe, kama ọ bu òkìkè ọhu.

16 Ka ha ra kwa, bú ndi gāgazi dika ihe-ọtùtù a si di, udo dikwasi ha, ya na ebere, dikwasi kwa Israel nke Chineke.

17 Site n’ub͕u a ka onye ọ bula ghara isob͕um: n’ihi na mu onwem nēbu n’arum apa di iche iche nēgosi na abum onye Jisus.

18 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere mọ-unu, umu-nnam. Amen.