Categories
NDI FILIPAI

NDI FILIPAI 1

1 Pọl na Timọti, ndi-orù nke Kraist Jisus, nēdegara ndi nsọ nile nime Kraist Jisus ndi nọ na Filipai akwukwọ, ha na ndi nēlekọta unu anya na ndi nējere unu ozi:

2 Amara diri unu na udo nke si n’aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.

3 Anamekele Chinekem na ncheta nile m’nēcheta unu,

4 mb͕e nile n’aririọ nile m’nāriọrọ unu nile nāriọ aririọ ahu nime ọṅù,

5 n’ihi nnwekọ unu nwekọrọ n’izisa ozi ọma site n’ubọchi mbu rue ub͕u a;

6 ebe m’tukwasiworo obim n’otù ihe nka, na Onye malitere ilu ezi ọlu nime unu gāluzu ya rue ubọchi Jisus Kraist:

7 dika o ziri ezi ka m’tukwasi uchem n’ihe a bayere unu nile, n’ihi na enwerem unu n’obim, ebe unu nile bu ndi nēsom n’inwekọ amara, ma nime ab͕um ma nime ngọpu nke ozi ọma na ime ka o guzosie ike.

8 N’ihi na Chineke bu onye-àmà nkem, otú agu unu nile nāgusim ike n’obi-ebere nke Kraist Jisus.

9 Nka ka m’nēkpe kwa ekpere, ka ihu-n’anya-unu we nābabiga kwa ókè kari nke-uku nime nmazu na nghọta nile;

10 ka unu we nwa ihe ha na ibe-ha di iche; ka unu we di ọcha n’obi ghara kwa isu ngọngọ rue ubọchi nke Kraist;

11 ebe unu gābu ndi juputaworo na nkpuru nke ezi omume, nke sitere n’aka Jisus Kraist, ka Chineke we nwe ebube na otuto.

12 Ma anamezube ka unu mara, umu-nnam, na, kama ihe ọzọ, ọnọdum emewo ka ozi ọma ga n’iru;

13 ya mere ab͕um putara ìhè nime Kraist na Pritoriọm dum, ya na n’ebe ndi nile fọduru nọ;

14 o me kwa ka ndi ka n’ọnu-ọgugu n’etiti umu-nna nime Onye-nwe-ayi nwebiga anya-ike ókè ikwu okwu Chineke nātughi egwu, ebe ha tukwasiworo obi site n’ab͕um.

15 Ọ bu ezie na ufọdu nēkwusa Kraist-ayi ọbuná n’ihi ekworo na esem-okwu; ma ufọdu nēkwusa kwa Ya n’ihi na ọ di ha ezi nma:

16 ndia nēme ya site n’ihunanya, ebe ha matara na edorom ka m’we gọpu ozi ọma:

17 ma ndi ahu nēkwusa Kraist-ayi site n’ikpa-iche-iche, ọ bughi n’idi-ọcha-n’obi, ebe ha nēchè na ha gēwelirim nkpab͕u n’ab͕um.

18 Gini kwa? ọ bu nání na n’uzọ ọ bula, ma ọ bu n’aghughọ ma-ọbu n’ezi-okwu, anēkwusa Kraist; nime nka ka m’nāṅuri kwa ọṅu, e, m’gāṅuri kwa ọṅu nime ya.

19 N’ihi na amataram na nka gēme ka m’nwe nzọputa, site n’aririọ-unu na nnyezu nke Mọ nke Jisus Kraist,

20 dika olile-anya siri ike na ntukwasi-obi nkem si di, na n’ihe ọ bula ọ dighi ihere gēmem, kama na agēme kwa ka Kraist di uku n’arum ub͕u a, otú ọ di mb͕e nile, ma ọ bu site na ndu, ma-ọbu site n’ọnwu, nime nkwuwa-okwu nile.

21 N’ihi na n’ebe m’nọ idi ndu bu Kraist, inwu anwu bu kwa urù.

22 Ma ọ buru na idi ndu n’anu-aru bu òkèm, nka bu nkpuru nke ọlum: ihe m’gārọputa kwa amaghi m.

23 Ma anọm n’ebe di nkpà n’etiti ihe abua ndia, ebe agu ila na inọ n’ebe Kraist nọ nāgum; n’ihi na ọ kachasi nma nke-uku:

24 ma inọgide n’anu-aru dikariri nkpà n’ihi unu.

25 Ebe m’tukwasiworo obi m n’ihe a, amataram na m’gānọgide, nọgide kwa n’etiti unu nile, ime ka unu ga n’iru ṅu kwa ọṅù nke okwukwe;

26 ka inya-isi-unu we babiga ókè nime Kraist Jisus n’arum site n’ọbibia m’gābiakute unu ọzọ.

27 Nání nēbinu obi dika ndi ala elu-igwe n’uzọ kwesiri ozi ọma nke Kraist: ka ọ gābu, ma m’bia hu unu ma-ọbu na anọghm, ka m’we nu ihe bayere ọnọdu-unu, na unu nēguzosi ike n’otù Mọ Nsọ, nēwere kwa otù nkpuru-obi lukọrọ okwukwe nke ozi ọma ahu ọ̀gù si-ike;

28 ghara ikwe ka ndi nēmegide unu me ka unu tua ujọ n’ihe ọ bula: ebe nke ahu bu ihe nēme ka ila-n’iyì putara ha ìhè, ma ọ nēme ka nzọputa-unu puta ìhè, nka site-kwa-ra na Chineke;

29 n’ihi na unu ka enyeworo ya n’amara n’ihi Kraist, ọ bughi nání ikwere na Ya, kama ihu kwa ahuhu n’ihi Ya:

30 ebe unu nwere otù nb͕a ahu nke unu huru n’arum, ub͕u a ka unu nānu kwa na ọ di n’arum.

Categories
NDI FILIPAI

NDI FILIPAI 2

1 Ya mere ọ buru na nkasi-obi ọ bula di nime Kraist, ọ buru na ngugu-obi ọ bula nke ihu-n’anya di, ọ buru na nnwekọ ọ bula nke Mọ Nsọ di, ọ buru na obi-ebere na ime-ebere ọ bula di,

2 menu ka ọṅùm juputa, ka unu we tukwasi uche-unu n’otù ihe ahu, nwe kwa otù ihunanya ahu, nēnwekọ otù nkpuru-obi, nēnwe otù uche;

3 unu emela ihe ọ bula n’uzọ ikpa-iche-iche ma-ọbu n’uzọ ichọ otuto efu, kama n’obi di ume-ala nāguritanu ibe-unu na ndi ka unu onwe-unu nma;

4 unu nile n’otù n’otù elela ihe nke aka unu anya, kama unu nile n’otù n’otù le kwa ihe nke madu-ibe-unu anya.

5 Nwenu uche a nime onwe-unu, nke di kwa nime Kraist Jisus:

6 Onye, ọ bu ezie na Ọ diri n’udi nke Chineke na mbu, ma Ọ gughi ya n’ihe O gējidesi ike, bú ira ka Chineke,

7 kama O mere Onwe-ya ihe-efu, n’inara udi nke orù, ewe me Ya n’oyiyi nke madu;

8 ebe ahuru Ya ka Ọ di ka madu n’oyiyi-Ya, O wedakwara Onwe-ya, we buru Onye nāṅa nti rue ọnwu, bú ọnwu nke obe.

9 N’ihi nka Chineke welikwara Ya elu nke-uku, were kwa amara nye Ya aha ahu nke kariri aha nile ọ bula elu;

10 ka ọ gābu n’aha Jisus ka ikperè nile we b͕ue n’ala, nke ihe nile di n’elu-igwe na ihe nile di n’elu uwa na ihe nile di n’okpuru ala,

11 ka ire nile ọ bula we kwuputa kwa na Jisus Kraist bu Onye-nwe-ayi, ka ewe nye Chineke, bú Nna, otuto.

12 Ya mere, ndi m’huru n’anya, dika unu ṅara nti mb͕e nile, ọ bughi nání mb͕e m’nọ n’etiti unu, kama ub͕u a mb͕e m’nānọghi, werenu egwu na ima-jijiji luputa kari nzọputa nke onwe-unu nke-uku;

13 n’ihi na ọ bu Chineke Onye nālusi ọlu ike nime unu ichọ-achọ-unu na ilusi-ọlu-ike-unu, n’ihi na ọ di Ya ezi nma.

14 Menu ihe nile nējighi ntamu na iru-uka ọ bula;

15 ka unu we ghọ ndi nādighi ita uta ndi nāghọghi kwa aghughọ, umu Chineke ndi anāpughi ita uta n’etiti ọb͕ọ b͕agọrọ ab͕agọ nke nēnwe kwa anya-uhie, ndi anāhu unu n’etiti ha dika ndi nēnye ìhè n’uwa,

16 nēche okwu nke ndu n’iru madu; ka m’we nwe ihe inya isi nye n’ubọchi nke Kraist, na ab͕aghi m ọsọ n’efu, na adọb͕ughkwam onwem n’ọlu n’efu

17 E, ọ buru kwa na anāwusim dika àjà-ihe-ọṅuṅu n’elu àjà na ifè-òfùfè nke okwukwe-unu, anamaṅuri ọṅu, so kwa unu nile nāṅuri ọṅu:

18 n’otù uzọ ahu unu onwe-unu, ṅuri-kwa-nu ọṅu, sokwam nāṅuri ọṅu.

19 Ma anamele anya nime Onye-nwe-ayi Jisus na m’gēzigara unu Timọti ọsọsọ, ka mu onwem we nwe kwa obi-utọ, mb͕e m’mara ọnọdu-unu.

20 N’ihi na enweghi m onye ọ bula nke nkpuru-obi-ya yiri nke ya, bú onye gēcheb͕u onwe-ya bayere ọnọdu-unu n’ezie.

21 N’ihi na ha nile nāchọ ihe nke aka ha, ọ bughi ihe nke Jisus Kraist,

22 Ma unu mara ọnwunwa-ya, na, dika nwa nēso nna-ya, otú a ka o sorom buru orù n’izisa ozi ọma.

23 Ya mere, onye a ka m’nēle anya na m’gēziga ya n’otù oge ahu, mb͕e ọ bula m’gāhu otú ọ gādirim:

24 ma anamatukwasi obim nime Onye-nwe-ayi na mu onwem gābia kwa ọsọsọ.

25 Ma anamagu ya ihe di nkpà izigara unu Epafrọdaitọs, bú nwa nna m na onye mu na ya nālukọ ọlu, onye mu na ya nēbukọ kwa agha, onye buru kwa onye-ozi-unu na onye nēfè òfùfè ib͕o nkpàm;

26 ebe agu unu nile nāgusi ya ike, obi lọ-kwa-ra ya miri, n’ihi na unu nuru na aru-ya adighi ike:

27 n’ihi na aru-ya adighi ike n’ezie, ọ nọ kwa nso ọnwu: ma Chineke mere ya ebere; ma ọ bughi nání ya onwe-ya, kama mu onwem kwa, ka m’we ghara inwe ihe-nwuta n’elu ihe-nwuta.

28 Ya mere ọ nānukarim ọku n’obi iziga ya, ka ọ gābu, mb͕e unu huru ya ọzọ, ka unu we ṅuria ọṅu, ka mu onwem we nwe kwa ihe-nwuta nke dikariri ntà.

29 Ya mere werenu ọṅù nile nara ya nke-ọma nime Onye-nwe-ayi; nāsọpuru-kwa-nu ndi di otú a:

30 n’ihi na ọ bu n’ihi ọlu Kraist ka ọ biaruru ọnwu nso, nēkwere itufu ndu-ya, ka o we mezu ihe fọduru unu ime n’ifè-òfùfè-unu n’ebe m’nọ.

Categories
NDI FILIPAI

NDI FILIPAI 3

1 Nke fọduru, umu-nnam, nāṅurinu ọṅu nime Onye-nwe-ayi. Idegara unu otù ihe ndia n’akwukwọ, n’ezie ọ bughi ihe-nsob͕u n’ebe m’nọ, ma n’ebe unu nọ ọ bu ihe-ntukwasi-obi.

2 Lezienu nkita ahu nile anya, lezienu ndi-ọlu ọjọ ahu anya, lezienu obibì-aru ahu anya:

3 n’ihi na ayi onwe-ayi bu ndi obibì-úgwù, ndi ji Mọ nke Chineke nēkpe ekpere, ndi nānya kwa isi nime Kraist Jisus, ndi natukwasighi kwa obi n’anu-aru-ayi:

4 ọ bu ezie na mu onwem puru itukwasi obi ọbuná n’anu aru: ọ buru na onye ọ bula ọzọ nēchè na ya puru itukwasi obi n’anu-aru, mu onwem puru itukwasi obi n’anu-aru kari:

5 ebìrim úgwù n’ubọchi nke-asatọ, esiterem n’umu Israel, site kwa n’ebo Benjamin, abum onye-Hibru nke sitere na ndi-Hibru; n’akuku iwu, abumri onye-Farisi;

6 n’akuku inu-ọku-n’obi, anamesob͕uri nzukọ Kraist; n’akuku ezi omume nke di nime iwu, ahuru na adighi m ita uta.

7 Otú ọ di, ihe ọ bula nke baram urù, ihe ndia ka m’guru n’ihe-iyì n’ihi Kraist-ayi.

8 E, tukwasi kwa, anamagu kwa ihe nile n’ihe-iyì n’ihi ọkika nke ọmuma Kraist Jisus, bú Onye-nwem: Onye m’yiri iyì ihe nile nkem n’ihi Ya, anamagu kwa ha n’ihe-nkpofu, ka m’we rita Kraist n’urù,

9 ewe hum nime Ya, nēnweghi ezi omume ọ bula nke akam, bú nke sitere n’iwu, kama nēnwe ezi omume ahu nke okwukwe ekwere na Kraist nēweta, bú ezi omume ahu nke sitere na Chineke n’elu okwukwe:

10 ka m’we mara Ya, na ike nke nbilite-n’ọnwu-Ya, na nnwekọ nke ahuhu-Ya nile, n’ihi na anēme ka mu na Ya nwekọ otù udi n’ọnwu-Ya;

11 ọ buru na uzọ ọ bula di m’gēsi ru isi na ndi nwuru anwu bilite.

12 Ọ bughi na anataram ya-ri, ma-ọbu na emewom ka m’zue okè ub͕u a: ma anamab͕aso, ka m’we jide, ma ọ buru na ọ gēkwem, ihe ahu nke Kraist Jisus jide-kwa-ram n’ihi ya.

13 Umu-nnam, mu onwem agughi onwem na ejidewom rue ub͕u a: ma otù ihe ka m’nēme, ebe m’nēchezọ ihe nile di n’azu, nēsetipu kwa aka n’ebe ihe nile di n’iru di,

14 anamab͕akuru ókè ib͕a-ọsọ ka m’we nata ihe anāb͕ata n’ọsọ nke ọkpukpọ di elu nke Chineke nime Kraist Jisus.

15 Ya mere, ka ayi ra, bú ndi tozuru okè, ka ayi tukwasi uche na nka: ọ buru kwa na unu tukwasi uche n’ihe ọ bula n’uzọ di iche, ọbuná nka ka Chineke gēkpughere unu:

16 náni nka, n’ihe ahu ayi b͕aruru, ka ayi nāgazi dika ihe ahu si di.

17 Umu-nnam, dinu n’otù n’iṅomim, nēle-kwa-nu ndi nējeghari otú a, otú unu nwere ayi dika ihe-atù

18 N’ihi na ọtutu nējeghari, ndi m’nāgwari unu okwu bayere ha ọtutu oge, ma ub͕u a ọ bu kwa n’ákwá ka m’nāgwa unu, na ha bu ndi-iro obe nke Kraist:

19 ndi ọgwugwu-ha bu ila-n’iyì, ndi chi-ha bu afọ-ha, ndi otuto-ha di kwa n’ihere-ha, ndi nātukwasi uche n’ihe uwa.

20 N’ihi na ala-ayi di n’elu-igwe ub͕u a; site n’ebe ayi nēchesi kwa Onye-nzọputa ike, bú Onye-nwe-ayi Jisus Kraist:

21 Onye gēme aru nke ọnọdu-ayi di ala ka o nwe oyiyi ọhu, ka ya na aru nke ebube-Ya we nwekọ otù udi, dika ilusi-ọlu-ike ahu si di nke O ji pu ọbuná ido ihe nile n’okpuru Onwe-ya.

Categories
NDI FILIPAI

NDI FILIPAI 4

1 Ya mere, umu-nnam m’huru n’anya ndi agu unu nāgusikwam ike, ọṅùm na okpu-ezem, guzosienu ike otú a nime Onye-nwe-ayi, ndi m’huru n’anya.

2 Ariọm Yuodia, ariọkwam Sintiki, ka ha tukwasi uche n’otù ihe ahu nime Onye-nwe-ayi.

3 E, ariọkwam gi, onye ekekọtaworo mu na gi n’ezie n’ọlu Chineke, yere ndinyom ahu aka, n’ihi na mu na ha b͕akọsiri nb͕a ike n’ozi oma, gi na Klement, na ndi fọduru mu na ha nālukọ ọlu, ndi aha-ha di n’akwukwọ nke ndu.

4 Nāṅurinu ọṅu n’Onye-nwe-ayi mb͕e nile: m’gāsi ọzọ, Nāṅurinu ọṅu.

5 Menu ka madu nile mara obi-ọma-unu. Onye-nwe-ayi nọ nso.

6 Unu echeb͕ula onwe-unu n’ihe ọ bula; kama n’ihe nile ọ bula site n’ekpere na aririọ, ya na ekele, menu ka Chineke mara ihe nile unu nāriọ.

7 Udo nke Chineke, nke kachasi uche nile, gēche kwa obi-unu na èchìchè-uche-unu nche nime Kraist Jisus.

8 Nke fọduru, umu-nnam, ka ihe bu ezi-okwu ra, ka ha ra, bú ihe kwesiri nsọpuru, ka ha ra, bú ihe ziri ezi, ka ha ra, bú ihe di ọcha, ka ha ra, bú ihe kwesiri ihu-n’anya, ka ha ra, bú ihe ekwuru nke-ọma; ọ buru na idi-nma ọ bula di, o buru kwa na otuto ọ bula di, nāgukọnu ihe ndia.

9 Ihe unu matara, nke unu nata-kwara, nke unu nu-kwa-ra, nke unu hu-kwa-ra n’arum, nēmenu ihe ndia: Chineke nke udo gānọyere kwa unu.

10 Ma aṅuri rim ọṅu nke-uku nime Onye-nwe-ayi, na ub͕u a n’oge a unu malitere ọhu itukwasi uche n’ihe bayerem; nke unu nātukwasiri uche-unu nime ya n’ezie, ma unu enweghi oghere.

11 Ọ bughi na anamekwu okwu bayere nkpà: n’ihi na mu onwem mutara, n’ọnọdu ọ bula m’nọ, inwezu nime ya ihe nile nākpam nkpà.

12 Amataram uzọ iweda onwem, amata-kwa-ram uzọ ibabiga ókè: n’ihe ọ bula na n’ihe nile ezíwo mu ihe-omimi a, bú inọ n’afọ-ojuju na inọ kwa n’agu, ibabiga ókè na inọ kwa na nkpà.

13 Enwerem ike n’ihe nile nime Onye ahu Nke nēmem ka m’di ike.

14 Otú ọ di, unu mere nke-ọma, n’isom nwekọ nkpab͕um.

15 Ma unu onwe-unu makwara, ndi Filipai, na nime nmalite nke ozi ọma, mb͕e m’siri na Masedọnia puta, ọ dighi nzukọ Kraist ọ bula nke mu na ya nwekọrọ ihe n’okwu bayere onyinye na ọnina, ma-ọbughi nání unu onwe-unu;

16 n’ihi na ọbuná na Tesalọnaika unu zigara otù mb͕e ziga kwa mb͕e ọzọ ib͕om nkpà.

17 Ọ bughi na anamachọ onyinye ahu; kama anamachọ nkpuru ahu nke nāba uba iguyere unu.

18 Ma enwezuwom ihe nile, anamababiga kwa ókè: emewo ka m’zue ezù, ebe m’natara n’aka Epafrọdaitọs ihe nile si n’aka-unu bia, isisì nke ihe ísì utọ, àjà nke anānara nke-ọma, nke nātọ Chineke ezi utọ.

19 Ma Chinekem gēnyezu unu ihe nile ọ bula nākpa unu dika àkù-Ya n’ebube si di, nime Kraist Jisus.

20 Ma otuto diri Chineke-ayi, bú Nna-ayi, rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

21 Kelenu onye nsọ ọ bula nime Kraist Jisus. Umu-nna-ayi ndi mu na ha nọ nēkele unu.

22 Ndi nsọ nile nēkele unu, ma ndi nke èzí-na-ulo Sisa kachasi n’ikele unu.

23 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist dinyere mọ-unu.