Categories
NDI EFESỌS

NDI EFESỌS 1

1 Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n’ọchichọ nke Chineke, nēdegara ndi nsọ ndi nọ n’Efesọs, na ndi kwere na Kraist Jisus, akwukwọ:

2 Amara diri unu na udo nke si n’aka Chineke, bu Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.

3 Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye were ngọzi nile ọ bula nke Mọ Nsọ gọzie ayi n’ebe di n’elu-igwe nime Kraist:

4 dika Ọ roputara ayi nime Ya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa, ka ayi we di nsọ buru kwa ndi anāpughi ita uta n’iru Ya n’ihu-n’anya:

5 ebe O buru uzọ ka ayi àkà ka ewe site n’aka Jisus Kraist do ayi ka umu-Ya ndikom, dika ọ di Ya ezi nma n’ọchichọ-Ya,

6 ka ewe to ebube nke amara-Ya, bú nke O were amara me ka ayi nara n’aka-Ya nime Onye ahu Ọ huru n’anya:

7 Onye ayi sitere n’ọbara-Ya nwe nb͕aputa-ayi nime Ya, bú nb͕aghara nke ndahie nile ayi, dika àkù nke amara-Ya si di,

8 nke O mere ka ọ babigara ayi ókè n’amam-ihe na uche nile,

9 mb͕e O mesiri ka ayi mara ihe-omimi nke ihe Ọ chọrọ, dika ọ di Ya ezi nma, bú ihe O zubere nime Ya,

10 rue ọchichi-èzi-na-ulo nke ozuzù oge akara àkà, ichikọta ihe nile nime Kraist-ayi dika Isi, bú ihe nile di n’elu-igwe, na ihe nile di n’elu uwa; nime Ya, ka m’kwuru,

11 Nke eme-kwa-ra ayi ka ayi buru ihe-nketa nime Ya, ebe eburu uzọ ka ayi àkà dika Onye ahu zubere, Onye nālusi ihe nile ike dika ìzù nke ọchichọ-Ya si di;

12 ka ayi we buru ihe agēji to ebube-Ya, ayi ndi leworo anya Kraist na mbu:

13 Onye unu onwe-unu nọ kwa nime Ya, mb͕e unu nuru okwu nke ezi-okwu ahu, bú ozi ọma nke nzọputa-unu, ọ bu kwa nime Ya, mb͕e unu kwekwa-ra na Ya, ka eji Mọ Nsọ nke nkwa ahu ka unu akàrà,

14 bú Mọ Nsọ, Onye bu ihe ayi ji mara na ayi gēketazu ihe-nketa-ayi, rue nb͕aputa nke ihe Chineke nwetara, ka ewe to ebube-Ya.

15 N’ihi nka mu onwem kwa, ebe m’nuru okwu bayere okwukwe di nime unu nke unu kwere n’Onye-nwe-ayi Jisus, na ihu-n’anya unu ji hu ndi nsọ nile,

16 ewepughi m aka n’ikele ekele bayere unu, nēhotakwa unu n’ekperem;

17 ka Chineke nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Nna nke ebube, we nye unu Mọ nke amam-ihe na nkpughe nime nmazu-Ya;

18 ebe emeworo ka anya obi-unu nara ìhè, ka unu we mata ihe bu olile-anya nke ọkpukpọ-Ya, mata kwa ihe bu àkù nke ebube nke ihe-nketa-Ya n’etiti ndi nsọ Ya,

19 mata kwa otú ike-Ya di uku ri nne n’ebe ayi nọ, bú ndi kwere, dika ilusi-ọ1u-ike nke idi-ike nke ike-Ya si di,

20 nke Ọ lusiri ike nime Kraist, mb͕e O mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, me kwa ka Ọ nọdu n’aka-nri-Ya n’ebe di n’elu-igwe,

21 kachasi ha nile elu, bú ibu-onye-isi, na ichi-isi, na ike, na ibu-onye-nwe-madu, na aha ọ bula anākpọ ya aha, ọ bughi nání n’oge a, kama ọ bu kwa n’oge nke gaje ibia:

22 O do-kwa-ra ihe nile n’okpuru ukwu-Ya abua, ọ bu kwa Ya onwe-ya ka O mere ka Ọ buru isi n’elu ihe nile n’ebe nzukọ-Ya nọ,

23 nke bu aru-Ya, ozuzù nke Onye ahu Nke nāluzu ihe nile nime madu nile.

Categories
NDI EFESỌS

NDI EFESỌS 2

1 Unu onwe-unu ka O me-kwa-ra ka unu di ndu, mb͕e, unu nọ n’ọnwu site na ndahie nile unu na nmehie nile unu,

2 nke unu jeghariri nime ha n’oge gara aga n’uzọ oge nke uwa nka, dika onye-isi nke ike nke mbara-elu-igwe si chọ, bú mọ ahu nke nālusi ọlu ike nime umu nke ekweyeghi-ekwenye ub͕u a;

3 ndi ayi onwe-ayi nile bi-kwa-ra obi n’etiti ha n’oge gara aga nime agu ihe ọjọ nke anu-aru-ayi, nēme ihe nile anu-aru-ayi na èchìchè-uche-ayi chọrọ, buru kwa umu nke iwe dika esi mu ayi, dika ndi fọduru bu kwa:

4 ma Chineke, ebe Ọ bu ọgaranya n’ebere, n’ihi oké ihunanya-Ya Ọ huru ayi,

5 ọbuná mb͕e ayi nọ n’ọnwu site na ndahie nile ayi, O mere ka ayi so Kraist dikọ ndu (ejiwo amara zọputa unu),

6 me kwa ka ayi so Ya si n’ọnwu bilikọ, me kwa ka ayi so Ya nọdukọ n’ebe di n’elu-igwe, nime Kraist Jisus:

7 ka Ọ we gosi ihe a n’oge nile gaje ibia, bú àkù nke amara-Ya di uku ri nne, n’obi-ọma n’ebe ayi nọ nime Kraist Jisus:

8 n’ihi na ọ bu amara ka ejiworo zọputa unu, site n’okwukwe; nka esiteghi kwa n’onwe-unu: ọ bu onyinye Chineke:

9 o siteghi n’ọlu, ka onye ọ bula we ghara inya isi.

10 N’ihi na ayi bu ihe O mere, ndi ekère èkè nime Kraist Jisus ilu ezi ọ1u, nke Chineke buru uzọ dozie ka ayi we jegharia nime ha.

11 N’ihi nka chetanu, na n’oge gara aga unu onwe-unu, bú ndi mba ọzọ n’anu-aru, ndi ha nākpọ aha Ebìghi-úgwù, bú ndi anākpọ aha Obibì-úgwù, n’anu-aru, nke eji aka me;

12 na unu guzoro iche n’ebe Kraist nọ n’oge ahu, ndi emereri ka unu buru ndi ala ọzọ n’ebe ọnọdu ndi amuru ndi Israel di, unu bu kwa ndi-ọbìa n’ebe ọb͕ub͕a-ndu nile nke nkwa ahu di, ndi nēnweghi olile-anya, ndi nāmaghi kwa Chineke n’uwa.

13 Ma ub͕u a nime Kraist Jisus unu onwe-unu, bú ndi nọ n’ebe di anya n’oge gara aga, unu ka emere ka unu nọ nso nime ọbara Kraist.

14 N’ihi na Ya onwe-ya bu udo-ayi, Onye mere ihe abua ahu ka ha buru otù ihe, Onye kwada-kwa-ra mb͕idi etiti nke ngige,

15 ebe ọ bu nime anu-aru-Ya ka O mere ka iro ahu ghara idi irè, bú iwu nke bu ihe di iche iche enyere n’iwu; ka O we were madu abua ahu kè otù madu ọhu nime onwe-ya, nēme ka udo di;

16 ka O we were kwa obe-Ya me ka ha abua na Chineke di n’otù nime otù aru, ebe O b͕usiri iro ahu nime ya:

17 O we bia zì unu ndi nọ n’ebe di anya ozi ọma nke udo, zì kwa ndi nọ nso ozi ọma nke udo:

18 n’ihi na ayi abua sitere n’aka-Ya nwe nkpọbata-ayi n’ebe Nna nọ nime otù Mọ Nsọ.

19 Ya mere otù a unu abughi ndi-ọbìa na ndi nānọ dika ọbìa ọzọ site n’ub͕u a, kama unu soro ndi nsọ buru ndi amuru n’ala, unu bu kwa ndi èzi-na-ulo Chineke,

20 ewu-kwa-ra unu dika ulo n’elu ntọ-ala nke bu ndi-ozi na ndi-amuma, nke isi nkume nime nkuku ntọ-ala ahu bu Kraist Jisus onwe-ya;

21 ọ bu kwa nime Ya ka ulo nile ọ bula anēwu n’ulo ahu, ebe anējikọ ha nke-ọma, nāba uba we buru ulo nsọ nime Onye-nwe-ayi;

22 Onye anēwukọ kwa unu onwe-unu nime Ya ka unu we buru ebe-obibi nke Chineke nime Mọ Nsọ.

Categories
NDI EFESỌS

NDI EFESỌS 3

1 N’ihi nka mu onwem Pọl, onye-nkpọrọ nke Kraist Jisus n’ihi unu ndi mba ọzọ,

2 asi na ọ bu ezie na unu nuru okwu bayere ọchichi-èzí-na-ulo nke amara Chineke ahu nke enyerem n’ebe unu nọ;

3 na emere ka m’mara ihe-omimi ahu n’uzọ nkpughe, dika m’deworo n’akwukwọ a na mbu n’okwu ole-na-ole,

4 nke unu gēji pu ihuta nghọtam n’ihe-omimi nke Kraist, mb͕e unu guru ya;

5 nke anēmeghi ka umu madu mara ya n’ọb͕ọ ọzọ, dika ekpughere ya ub͕u a nye ndi-ozi-Ya na ndi-amuma-Ya di nsọ nime Mọ Nsọ;

6 bú, na ndi mba ọzọ bu ndi soro ayi ketakọ ihe, na idikọ n’otù aru, na ikèkọ nkwa ahu nime Kraist Jisus site n’ozi ọma,

7 nke emerem ka m m’buru onye nēje ozi ya, dika onyinye nke amara ahu nke Chineke si di nke enyerem dika ilusi-ọlu-ike nke ike-Ya si di.

8 Ọ bu mu onwem, bú onye di ntà kari onye dikarisiri ntà n’etiti ndi nsọ nile, ka enyere amara nka, izisara ndi mba ọzọ ozi ọma nke àkù nke Kraist nke anēnweghi ike ituputa ya;

9 na inye ha nile ìhè ihu ihe bu ọchichi-èzí-na-ulo nke ihe-omimi ahu nke ezoworo nime Chineke site n’oge nile, Onye kère ihe nile;

10 ka ewe me ub͕u a ka ibu-isi nile na ike nile nke di n’ebe di n’elu-igwe mara ọtutu okpukpu amam-ihe Chineke di iche iche site n’aka nzukọ-Ya,

11 dika ìzù nke mb͕e nile ebighi-ebi si di nke O zubere nime Kraist-ayi, bú Jisus Onye-nwe-ayi:

12 ọ bu kwa nime Ya ka ayi sitere n’okwukwe nke ayi kwere na Ya nwe nkwuwa-okwu na nkpọbata nime ntukwasi-obi.

13 N’ihi nka ariọm aririọ ka ike ghara igwu unu n’obi nime nkpab͕um nile n’ihi unu, nke bu otuto-unu.

14 Ọ bu n’ihi nka ka m’ji b͕ue ikperèm abua n’ala nye Nna-ayi,

15 Onye esitere na Ya gu eriri-nna nile ọ bula n’elu-igwe na n’elu uwa aha,

16 ka O we nye unu, dika àkù nke ebube-Ya si di, ka ewere ike me ka unu di ike site n’aka Mọ-Ya nābata nime madu ime unu;

17 ka Kraist we site n’okwukwe-unu bigide nime obi-unu; ka unu, ebe unu b͕agideworo nkpọrọgwu nime ihu-n’anya buru kwa ndi atọworo ntọ-ala nime ya,

18 ka unu we nara ike ighọta, unu na ndi nsọ nile, ihe bu obodobo na ogologo na idi-elu na omimi,

19 na imara ihu-n’anya Kraist nke kariri ọmuma nke-uku ri nne, ka ewe me ka unu zue ezù rue ozuzù nile nke Chineke.

20 Ma otuto diri Onye ahu Onye puru imebiga ókè nke-uku ri nne kari ihe nile nke ayi nāriọ ma-ọbu nke ayi nātughari uche, dika ike nke nālusi ike nime ayi si di,

21 otuto diri Ya nime nzukọ-Ya na nime Kraist Jisus rue ọb͕ọ nile nke mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

Categories
NDI EFESỌS

NDI EFESỌS 4

1 Ya mere mu onwem, bú onye-nkpọrọ nime Onye-nwe-ayi, nāriọ unu ka unu jegharia dika o kwesiri ọkpukpọ nke akpọrọ unu,

2 n’obi di ume-ala na idi-nwayọ nile, n’ogologo ntachi-obi, nānagiderita ibe-unu nime ihu-n’anya;

3 nānu ọku n’obi idebe idi-n’otù nke Mọ Nsọ nime ihe-ọkiké nke bu udo.

4 Otù aru di, otù Mọ di kwa, dika akpọ-kwa-ra unu nime otù olile-anya nke ọkpukpọ-unu;

5 otù Onye-nwe-ayi di, otù okwukwe di, otù baptism di,

6 otù Chineke na Nna nke ayi nile di, Onye bu isi ayi nile, Onye site-kwa-ra n’aka ayi nile nālu ọlu, Onye nānọ kwa nime ayi nile.

7 Ma ọ bu ayi nile n’otù n’otù ka enyere amara ahu dika ọtùtù nke onyinye Kraist si di.

8 N’ihi nka Ọ si,

Mb͕e Ọ rigoro n’elu, Ọ dọtara usu ndi adọtara n’agha n’agha,

Nye kwa madu onyinye di iche iche.

9 (Ma okwu nka, Ọ rigoro, gini ka ọ bu ma-ọbughi na Ọ rida-kwa-ra nime akuku uwa dikariri ala?

10 Onye ridara bu kwa Onye ahu Nke rigoro n’ebe kachasi elu-igwe nile elu nke-uku, ka O we mezu ihe nile.)

11 Ya onwe-ya nye-kwa-ra ufọdu ka ha buru ndi-ozi; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi-amuma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nēzisa ozi ọma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nāzù aturu Chineke na ndi-ozizí;

12 ime ka ndi nsọ zu okè ilu ọlu nke ije-ozi, iwuli aru nke Kraist elu dika ulo:

13 rue mb͕e ayi nile gēru idi-n’otù nke okwukwe na nke nmazu nke Ọkpara Chineke, ru ibu nwoke tozuru okè, ru ọtùtù nke ogologo nke ozuzù nke Kraist:

14 ka ayi we ghara ibu umu ọhu ọzọ, ndi ifufe nile ọ bula nke ozizí nēfeghari nēbughari kwa, nime itu-ntu nke madu, nime aghughọ, nke ha ji ezuputa nduhie;

15 kama ka ayi we nēso ezi-okwu nime ihu-n’anya, we tó etó rue nime Ya n’ihe nile, Onye bu isi-ayi, bú Kraist;

16 Onye aru nile, ebe anēwere nkwonkwo nile ọ bula nke nnyezu kwukọ ya nke-ọma jikọ kwa ya, dika ilusi-ọ1u-ike nke akuku nile ọ bula n’otù n’otù n’ọtùtù-ha si di, aru nile ahu nēsite na Ya nēme ka aru ba uba iwuli onwe-ya elu dika ulo nime ihu-n’anya.

17 Ya mere nka ka m’nēkwu, kwusi kwa ike nime Onye-nwe-ayi, ka unu ghara ijeghari ọzọ dika ndi mba ọzọ nējeghari kwa, n’ihe-efu nke uche-ha,

18 n’ihi na emewo ka ha b͕a ọchichiri n’èchìchè-uche-ha, eme kwa ka ha buru ndi ala ọzọ n’ebe ndu nke Chineke di n’ihi amaghi-ihe di nime ha, n’ihi na anēme ka obi-ha me etili;

19 madu ndi, ebe nmehie-ha nādighi-ewuta ha ọzọ, ha rara onwe-ha nye n’aka agu ikwa-iko, iluputa adighi-ọcha nile nime anya-uku.

20 Ma unu onwe-unu amutaghi Kraist-ayi otú a;

21 asi na ọ bu ezie na ọ bu Ya onwe-ya ka unu nuru, asi kwa na ọ bu nime Ya ka ezíri unu ihe, dika ezi-okwu di nime Jisus:

22 ka unu tupu madu ochie unu, nke nēmebi emebi n’uzọ agu nke aghughọ, dika ibi-obi-unu na mbu si di;

23 ka eme kwa ka unu di ọhu na mọ nke uche-unu,

24 ka unu yikwasi kwa madu ọhu unu, nke ekère dika Chineke chọrọ nime ezi omume na idi-ọcha nke ezi-okwu ahu.

25 N’ihi nka, ebe unu tupuru okwu-ugha, nēkwunu ezi-okwu onye ọ bula n’ebe onye-ab͕ata-obi-ya nọ: n’ihi na ayi nāburita ihe di n’aru ibe-ayi.

26 Unu emehiela mb͕e unu nēwe iwe: ekwela anyanwu da na nkpasu-iwe-unu:

27 enye-kwa-la ekwensu uzọ.

28 Ka onye nēzu ori ghara izu kwa ori ọzọ: kama ka ọ dọb͕u onwe-ya n’ọlu, nēji aka ya abua lu ezi ihe, ka o we nwe ihe ya na onye nọ na nkpà gēketa.

29 Ka okwu ọ bula nke ruru aru ghara isi n’ọnu-unu puta, kama ihe bu ezi ihe, iwuli madu elu dika ulo, dika nkpà si di, ka o we nye ndi nānu ya amara.

30 Unu eme-kwa-la ihe gēwuta Mọ Nsọ nke Chineke, Onye akara unu akàrà nime Ya rue ubọchi nb͕aputa.

31 Ka ewepu ihe-ilu na ọnuma na iwe na iti-nkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọ nile, n’etiti unu:

32 nweritanu obiọma n’aru ibe-unu, nwenu obi ọmiko, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, dika Chineke were-kwa-ra amara b͕aghara unu nime Kraist.

Categories
NDI EFESỌS

NDI EFESỌS 5

1 Ya mere burunu ndi nēṅomi Chineke. dika umu ahuru n’anya;

2 nējeghari-kwa-nu n’ihu-n’anya, dika Kraist-ayi hu-kwa-ra unu n’anya, rara kwa Onwe-ya nye n’ihi ayi, dika ihe echere n’iru Chineke na àjà achuru nye Ya ka ọ buru isisì nke ihe ísì utọ.

3 Ma ikwa-iko, na adighi-ọcha nile, ma-ọbu anya-uku, ka aghara ikpọ ọbuná aha-ya n’etiti unu, dika o kwesiri ndi nsọ;

4 ma-ọbu ihe-ihere, ma-ọbu ikwu-okwu-nzuzu, ma-ọbu okwu nābaghi n’ihe, nke nēkwesigh: ma kama nke ahu ikele-ekele.

5 N’ihi na nka ka unu matara nke-ọma, na ọ dighi onye ọ bula nke bu onye nākwa iko, ma ọbu onye n-adighi ọcha, ma-ọbu onye-anya-ukwu, nke isi-ya bu onye nēkpere arusi, nwere ihe-nketa n’ala-eze nke Kraist na Chineke.

6 Unu ekwela ka onye ọ bula were okwu efu rafue unu: n’ihi na ọ bu n’ihi ihe ndia ka iwe Chineke nābiakwasi umu nke ekwenyeghi-ekwenye.

7 Ya mere, unu esola ha kekọ ihe;

8 n’ihi na unu buri ọchichiri n’oge gara aga, ma unu bu ìhè ub͕u a nime Onye-nwe-ayi: nējegharinu dika umu nke ìhè

9 (n’ihi na nkpuru nke ìhè ahu di n’idi-nma na ezi omume na eziokwu nile),

10 nānwaputa ihe di Onye-nwe-ayi ezi mma;

11 unu esola ọlu nke ọchichiri nke nāmighi nkpuru nēnwekọ ihe, ma kama nke ahu nātu-kwa-nu ha nmehie-ha n’anya;

12 n’ihi na ọ bu ihe-ihere ọbuná ikwu okwu bayere ihe nile ha nēme na nzuzo.

13 Ma ìhè nēme ka ihe nile puta ìhè mb͕e anātu ha nmehie-ha n’anya: n’ihi na ihe ọ bula anēme ka ọ puta ìhè bu ìhè.

14 N’ihi nka Ọ si, Teta, gi onye nāraru ura, Si kwa na ndi nwuru anwu bilie, Kraist ahu gāmukwasi kwa gi.

15 Ya mere lezienu anya nke-ọma otú unu nējeghari, ọ dighi ka ndi nāmaghi ihe, kama dika ndi mara ihe;

16 nāzuchapuru onwe-unu oge a nile, n’ihi na ubọchi ndia jọrọ njọ.

17 N’ihi nka unu aghọla ndi nēnweghi uche, kama ghọtanu ihe bu ihe Onye-nwe-ayi nāchọ.

18 Unu aṅubiga-kwa-la manya ókè, nke ndu ila-n’iyì di nime ya, kama juputanu na Mọ Nsọ;

19 nēwere abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ gwarita onwe-unu okwu, nēwere obi-unu bù abù kpọ kwa ubọ nye Onye-nwe-ayi;

20 nēkele kwa Chineke, bú Nna, ekele mb͕e nile n’ihi ihe nile n’aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist;

21 nēdorita onwe-unu n’okpuru ibe-unu nime egwu Kraist.

22 Ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n’okpuru di nke aka unu, dika n’okpuru Onye-nwe-ayi.

23 N’ihi na di bu isi nke nwunye, dika Kraist-ayi bu kwa isi nzukọ-Ya, ebe Ya onwe-ya bu Onye-nzọputa nke aru.

24 Ma dika anēdo nzukọ ahu n’okpuru Kraist-ayi, otú a ka ndi bu nwunye do kwa onwe-ha n’okpuru di-ha n’ihe nile ọ bula.

25 Ndi bu di, hunu nwunye-unu n’anya, dika Kraist-ayi hu-kwa-ra nzukọ-Ya n’anya, rara kwa Onwe-ya nye n’ihi ya;

26 ka O we do ya nsọ, mb͕e O mesiri ka ọ di ọcha site n’ọsisa miri n’okwu Chineke,

27 ka Ya onwe-ya we che nzukọ ahu n’iru Onwe-ya dika ihe di ebube, nēnweghi ntupọ ma-ọbu iru-ndọli ma-ọbu ihe ọ bula n’ihe di otú a; kama ka o we di nsọ buru kwa ihe anāpughi ita uta.

28 Otú a ndi bu di ji kwa ugwọ ihu nwunye nke aka ha n’anya dika ha huru aru nke onwe-ha n’anya. Onye nāhu nwunye nke aka ya n’anya nāhu onwe-ya n’anya:

29 n’ihi na ọ dighi onye ọ bula kpọrọ aru onwe-ya asì mb͕e ọ bula; kama ọ nāzù ya nēlezi kwa ya anya nke-ọma, dika Kraist nēme kwa nzukọ-Ya;

30 n’ihi na ayi bu ihe di n’aru-Ya.

31 N’ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n’aru nwunye-ya; ha abua ewe ghọ otù anu-aru.

32 Ihe-omimi a di uku: ma mu onwem nēkwu okwu bayere Kraist baye-kwa-ra nzukọ-Ya.

33 Otú ọ di, unu onwe-unu n’otù n’otù hu kwa nwunye-unu n’anya, onye ọ bula ya hu nwunye nke aka ya n’anya, dika ọ nāhu onwe-ya n’anya; ka nwunye lezi kwa anya ka ọ nātu egwu di ya.

Categories
NDI EFESỌS

NDI EFESỌS 6

1 Umu, nāṅanu nti okwu ndi muru unu nime Onye-nwe-ayi: n’ihi na nka bu ihe ziri ezi.

2 Sọpuru nna-gi na nne-gi (nke bu ihe mbu enyere n’iwu nke nkwa diri ya),

3 ka ihe we nāgara gi nke-ọma, ka i we di kwa ogologo ndu n’elu uwa.

4 Ndi bu nna, akpasu-kwa-la umu-unu iwe: kama nāzùputa ha n’ọzùzù na idu-ọdu nke Onye-nwe-ayi.

5 Ndi-orù, werenu egwu na ima-jijiji nāṅa nti okwu ndi bu ndi-nwe-unu n’uzọ anu-aru, nime afọ-ofufo nke obi-unu, dika unu nēmere Kraist;

6 ọ bughi n’uzọ ibu-orù-n’anya, dika ndi nēme otú ọ gātọ madu utọ; kama dika ndi-orù Kraist, nēme ihe Chineke nāchọ site na nkpuru-obi-unu;

7 were-kwa-nu obi-ọma nābu orù, dika ọ bu Onye-nwe-ayi ka unu bu orù-Ya, ọ bughi kwa madu:

8 ebe unu matara na ezi ihe ọ bula onye ọ bula nēme, nka ka ọ gānaghachi n’aka Onye-nwe-ayi, ma ọ bu orù ma-ọbu onye nwe onwe-ya.

9 Ndi-nwe madu, nēme-kwa-ranu ha otù ihe ahu, nārapu iba-nba-unu: ebe unu matara na Onye-nwe ma ha ma unu nọ n’elu-igwe, ile-madu-anya-n’iru adighi kwa n’ebe Ọ nọ.

10 Nke fọduru, menu onwe-unu ka unu di ike nime Onye-nwe-ayi, ya na nime idi-ike nke ike-Ya.

11 Yikwasinu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ihe nile ekwensu nēzuputa.

12 N’ihi na ib͕a-nb͕a-ayi abughi imegide anu-aru na ọbara, kama ọ bu imegide ibu-ndi-isi nile, imegide ichi-isi nile, imegide ndi-onwe-uwa nke ọchichiri a, imegide ndi-agha mọ nke ajọ ihe n’ebe di n’elu-igwe.

13 N’ihi nka chilienu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ndi-iro-unu n’ajọ ubọchi, na iguzo, ebe unu luputaworo ihe nile.

14 Ya mere guzonu, mb͕e unu weresiri ezi-okwu ke úkwù-unu, were kwa ihe-agha nke nēb͕ochi obi yikwasi, bú ezi omume,

15 were kwa nkwadebe nke bu ozi ọma nke udo yikwasi n’ukwu-unu;

16 tukwasi ihe nile ndia welienu ọta nke bu okwukwe, nke unu gāpu imenyu àkú-uta nile nēnwu ọku nke ajọ onye ahu nime ya.

17 Nara-kwa-nu okpu-agha nke bu nzọputa, ya na mma-agha nke Mọ Nsọ, nke bu okwu Chineke:

18 site-kwa-nu n’ekpere na aririọ nile nēkpe ekpere n’oge nile nime Mọ Nsọ, were kwa inọgidesi-ike na iriọ-aririọ nile bayere ndi nsọ nile nāmu anya ime nka,

19 nēkpe kwa ekpere n’ihim, ka ewe nyem okwu n’isaghe ọnum, iwere nkwuwa-okwu me ka madu mara ihe-omimi nke ozi ọma,

20 nke m’bu ukọ̀ nime nkpọrọ n’ihi ya; ka m’we kwuwa okwu nime ya, dika m’nāghaghi ikwu.

21 Ma ka unu onwe-unu we mata kwa ihe nile bayerem, otú m’nēme, Tikikọs, onye bu nwa-nna-ayi ahu ahuru n’anya, bu kwa onye kwesiri ntukwasi-obi n’ije-ozi nime Onye-nwe-ayi, ọ gēme ka unu mara ihe nile:

22 onye m’nēzigara unu ime otù ihe a, ka unu we mara otú ihe nāgara ayi, ka o we kasi kwa obi-unu.

23 Udo diri umu-nna-ayi, ya na ihu-n’anya nke ya na okwukwe yikọ, site na Chineke, bú Nna, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.

24 Ka amara diyere ndi nile huru Onye-nwe-ayi Jisus Kraist n’anya n’emebighi-emebi.